Categories
MATIU

MATIU 21

1 Ma mb͕e ha biaruru Jerusalem nso, bia kwa na Betfagi, rue ugwu Olive, mb͕e ahu Jisus zigara madu abua nēso uzọ-Ya,

2 si ha, Ganu n’obodo ntà nke di na ncherita-iru unu, ngwa ngwa unu gāhu inyinya-ibu elibeworo, ya na nwa-inyinya-ibu: tọpunu ha, sekputaram ha.

3 Ọ buru kwa na onye ọ bula si unu ihe ọ bula, unu gāsi, Ha di Onye-nwe-ayi nkpà; ngwa ngwa ọ gēzite ha.

4 Ma emewo nka, ka okwu ekwuru site n’ọnu onye-amuma we mezu, si,

5 Sinu ada Zaion,

Le, Eze-gi nābiakute gi,

Ọ di nwayọ, Ọ nānọkwasi kwa n’inyinya-ibu,

Na n’elu nwa-inyinya-ibu, bú nwa anu nēbu ibu.

6 Ndi ahu ndi nēso uzọ-Ya we ga, me dika Jisus nyere ha iwu,

7 ha we sekputa inyinya-ibu ahu, na nwa-inyinya-ibu ahu, wukwasi ha uwe-ha; O we nọkwasi ha.

8 Ndi kariri n’ìgwè madu ahu we tusa uwe-ha n’uzọ; ndi ọzọ b͕ubitara alaka n’osisi, tusa kwa ha n’uzọ.

9 Ìgwè madu nile ndi nāga n’iru Ya, ndi nēso kwa, nēti nkpu, si, Hosanna diri Nwa Devid: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n’aha Onye-nwe-ayi; Hosanna n’ebe kachasi ihe nile elu.

10 Mb͕e Ọ batara na Jerusalem, obodo ahu nile we ma jijiji, si, Ònye bu Nwoke a?

11 Ìgwè madu ahu we nāsi, Nwoke a bu Onye-amuma ahu, Jisus, Nke si na Nazaret nke Galili bia.

12 Jisus we ba n’ulo uku Chineke, chupu ndi nile nēre nāzu kwa n’ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru;

13 Ọ si ha, Edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere: ma unu onwe-unu nēme ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.

14 Ndi-ìsi na ndi-ngwurọ we biakute Ya n’ulo uku Chineke: O we me ka aru-ha di ike.

15 Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ huru ọlu-ebube nile Ọ luru, na umuaka ndi nēti nkpu n’ulo uku Chineke, si, Hosanna diri Nwa Devid; iwe were ha nke-uku,

16 ha si Ya, Ì nānu okwu umuntakiri ndia nēkwu? Jisus we si ha, E: Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru, I si n’ọnu umu ọhu na umu nāṅu ara me ka ọjija zue okè?

17 O we rapu ha, si n’obodo ahu pua je Betani, nọ ọnọdu-abali n’ebe ahu.

18 Ma n’ututu mb͕e Ọ nālaghachi n’obodo ahu, agu guru Ya.

19 Mb͕e Ọ huru otù osisi fig n’uzọ, Ọ biarue ya aru, ma Ọ hughi ihe ọ bula n’elu ya, ma-ọbughi nání akwukwọ ndu; O we si ya, Ka nkpuru ghara iputa n’elu gi ọzọ ebighi-ebi. Osisi fig ahu we kpọnwua n’otù mb͕e ahu.

20 Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, o ju ha anya, ha si, Òsisi fig ahu si aṅa kpọnwua n’otù mb͕e a?

21 Jisus we za, si ha, N’ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe, ghara inwe obi abua, ọ bughi nání ihe emere osisi fig nka ka unu gēme, ma ọ buru na unu gāsi ọbuná ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri, agēme ihe ahu.

22 Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu gāriọ n’ekpere, ma asi na unu kwere, unu gānata kwa ha.

23 Mb͕e Ọ batara n’ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we biakute Ya mb͕e O nēzí ihe, si, Ọ̀ bu n’aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ònye nye-kwa-ra Gi ike a?

24 Ma Jisus zara, si ha, Mu onwem gāju kwa unu otù okwu, ọ buru na unu agwam ya, Mu onwem gāgwa kwa unu aha ike M’ji eme ihe ndia.

25 Baptism nke Jọn, òle ebe o si puta? ò sitere n’elu-igwe, ma-ọbu na o sitere n’aka madu? Ha we kwurita n’etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n’elu-igwe; Ọ gāsi ayi, N’ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya?

26 Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n’aka madu; ayi nātu egwu ìgwè madu a; n’ihi na madu nile nāgu Jọn dika onye-amuma.

27 Ha we za Jisus, si, Ayi amataghi. Ọ si-kwa-ra ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M’ji eme ihe ndia.

28 Ma gini bu uche-unu? Otù nwoke nwere umu abua; o we biakute nke-mbu, si, Nwa, je lua ọlu ta n’ubi-vine nkem.

29 Ma ọ zara, si, Achọghm ije: ma emesia ọ kwa uta, we je.

30 O we biakute nke-abua, kwue otú ahu. O we za, si, Mu onwem gēje, Onye-nwe-ayi: ma o jeghi.

31 Ònye nime ha abua mere ihe nna-ya chọrọ? Ha si, Onye mbu. Jisus si ha, N’ezie asim unu, na ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko nēbu unu uzọ abà n’ala-eze Chineke.

32 N’ihi na Jọn biakutere unu n’uzọ ezi omume, ma unu ekweghi ya: ma ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko kwere ya: ma mb͕e unu huru ya, unu onwe-unu akwaghi uta ọbuná emesia, ka unu we kwere ya.

33 Nurunu ilu ọzọ: Otù nwoke di, bú nna-nwe-ulo, onye kuru ubi-vine, b͕a ya ogige buruburu, gwu kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nime ya, wu kwa ulo-elu, were kwa ya tiyere n’aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.

34 Ma mb͕e oge nkpuru ruru nso, o zigara ndi-orù-ya jekuru ndi-ọlu-ubi ahu, inata nkpuru-ya.

35 Ndi-ọlu-ubi ahu we jide ndi-orù-ya, pia otù onye ihe, b͕u kwa nke-ọzọ, tu kwa nke-ọzọ nkume.

36 Ọzọ, o zigara ndi-orù ọzọ di ọtutu kari ndi mbu: ha we me kwa ha otú ahu.

37 Ma emesia o zigara ha ọkpara-ya, si, Ha gāsọpuru ọkparam.

38 Ma ndi-ọlu-ubi ahu, mb͕e ha huru ọkpara ahu, ha sirita onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, nwere kwa ihe-nketa-ya.

39 Ha we jide ya, tupu ya n’azu ubi-vine ahu, b͕ue ya.

40 Ya mere, mb͕e ọ bula onye-nwe ubi-vine ahu gābia, gini ka ọ gēme ndi-ọlu-ubi ahu?

41 Ha si ya, Ọ gāla ndi ọjọ ahu n’iyì n’uzọ jọrọ njọ, ọ gēwere kwa ubi-vine-ya tiye n’aka ndi-ọlu-ubi ọzọ, ndi gēnyeghachi ya nkpuru-ya n’oge-ha.

42 Jisus si ha, Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru n’ihe edeworo n’akwukwọ nsọ,

Nkume nke ndi nēwu ulo juru,

Nke ahu ka emere isi nkuku ulo:

Ọ bu n’aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere,

Ọ bu kwa oké ọlu n’anya-ayi?

43 N’ihi nka ka M’ji si unu, Agānara unu ala-eze Chineke, we nye mba ọzọ nke nāmi nkpuru-ya.

44 Agētiwasi kwa onye dakwasiri nkume a: ma onye ọ bula ọ gādakwasi, ọ gēfesa ya dika ájá.

45 Mb͕e ndi-isi-nchu-aja na ndi-Farisi nuru ilu-Ya nile, ha we mara na Ọ nēkwu okwu bayere ha.

46 Mb͕e ha nāchọ ijide Ya, ha we tua egwu ìgwè madu nile, ebe ha guru Ya n’onye-amuma.

Categories
MATIU

MATIU 22

1 Jisus we za, gwa ha okwu ọzọ n’ilu, si,

2 Eji ala-eze Chineke tuyere otù nwoke bú eze, nke siri oriri ọlulu-nwunye nye nwa-ya nwoke,

3 zipu kwa ndi-orù-ya ikpọ ndi akpọrọri ibia n’oriri ọlulu-nwunye ahu: ma ha achọghi ibia.

4 Ọzọ, o zipuru ndi-orù ọzọ, si, Gwa ndi akpọrọri, si, Le, edozisiwom oririm: eb͕usiwo oke-ehim nile na anum nile azùru azù, edozisiwo ihe nile: bianu n’oriri ọlulu-nwunye nkem.

5 Ma ha lefuru ya anya, je ebe nke ha, otù onye n’ubi nke aka ya, nke-ọzọ n’ihe-ahia-ya:

6 ma ndi fọduru jidere ndi-orù-ya, me ha ihe-ihere, b͕u kwa ha.

7 Ma eze ahu were iwe; o we ziga usu-ndi-agha-ya nile, la ndi-ob͕u-madu ahu n’iyì, rechapu kwa obodo-ha ọku.

8 Mb͕e ahu ọ si ndi-orù-ya, Edozisiwo ọlulu-nwunye nkem, ma ndi akpọrọri ekwesighi.

9 Ya mere, ganu n’ab͕ata uzọ nile, ka ha ra kwa, bú ndi unu gāhu, kpọ ha bia n’oriri ọlulu-nwunye nkem.

10 Ndi-orù ahu we pua ga n’uzọ nile, me ka madu nile ha huru zukọ, ka ha ra, ma ajọ madu ma ezi madu: ulo anālu nwunye we juputa na ndi nọduru na nri.

11 Ma mb͕e eze ahu batara ikiri ndi nọduru na nri, ọ hu n’ebe ahu otù nwoke nke nēyighi uwe ọlulu-nwunye:

12 o we si ya, Eyìm, ì si aṅa bata n’ebe a nēyighi uwe ọlulu-nwunye? Ma o kpuchiri ọnu.

13 Mb͕e ahu eze ahu siri ndi nējere ya ozi, Kenu ya ukwu na aka, tupu ya n’ọchichiri nke èzí; n’ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

14 N’ihi na ndi akpọworo di ọtutu, ma ndi arọputaworo di ole-na -ole.

15 Mb͕e ahu ndi-Farisi gara, we b͕a ìzù otú ha gēme ka Ọ ma n’ọnyà n’okwu.

16 Ha we zigara Ya ndi nēso uzọ-ha, ha na ndi Herod, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I nēzí kwa uzọ Chineke n’ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n’ihi na I dighi-ele madu anya n’iru.

17 Ya mere, gwa ayi, Gini bu uche-Gi? Ò ziri ezi n’iwu itu ùtú nye Sisa, ma -ọbu na ò zighi ezi?

18 Ma Jisus mara ajọ ihe-ha, Ọ si, Gini mere unu nānwam, ndi-iru-abua?

19 Gosinum ego nke ùtú. Ha we wetara Ya otù shilling.

20 Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya?

21 Ha si Ya, Sisa nwe. Mb͕e ahu Ọ si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.

22 Mb͕e ha nuru ya, o we ju ha anya, ha we rapu Ya, je nke ha.

23 N’ubọchi ahu ndi-Sadusi biakutere Ya nāsi na nbilite-n’ọnwu adigh: ha we jua Ya,

24 si, Onye-ozizí, Moses siri, Ọ buru na nwoke anwua, nēnweghi umu, nwa-nne-ya nwoke gālu ọlu kwesiri nwa-nne di n’ebe nwunye-ya nọ, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.

25 Ma umu-nne-ndikom asa di n’etiti ayi: nke-mbu luru nwunye, we nwua, ma ebe ọ nēnweghi nkpuru ọ rapuru nwunye-ya nye nwa-nne-ya;

26 otú a ka nke-abua me-kwa-ra, nke-atọ kwa, rue nke-asa.

27 Mb͕e ha nile nwusiri nwanyi ahu nwu-kwa-ra.

28 Ya mere, na nbilite-n’ọnwu nwùnye onye n’etiti ha asa ka ọ gābu? n’ihi na ha nile nwere ya na nwunye.

29 Ma Jisus zara, si ha, Unu nēhie uzọ, ebe unu amataghi ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke.

30 N’ihi na nime nbilite-n’ọnwu ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n’ọlulu-di, kama ha di ka ndi-mọ-ozi di n’elu-igwe.

31 Ma n’okwu bayere nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu, ùnu agughi okwu Chineke gwara unu, si,

32 Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob? Chineke abughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu.

33 Ma mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ibobo ozizí-Ya nwuru ha n’aru.

34 Ma ndi-Farisi, mb͕e ha nuru na O mereri ka ndi-Sadusi kpuchie ọnu-ha, ha zukọrọ n’otù ebe.

35 Otù onye n’etiti ha, bú onye-iwu, we jua Ya ajuju, nānwa Ya,

36 si, Onye-ozizí, òle ihe di uku nke enyere n’iwu nime iwu-ayi?

37 Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n’anya.

38 Nka bu ihe uku na ihe mbu enyere n’iwu.

39 Ihe nke-abua nke yiri ya bu nka, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi.

40 Iwu dum, na ndi-amuma Chineke, nēkokwasi n’ihe abua ndia enyere n’iwu.

41 Ma mb͕e ndi-Farisi zukọsiri, Jisus juru ha,

42 si, Gini bu uche-unu bayere Kraist ahu? Nwà onye ka Ọ bu? Ha si Ya, Nwa Devid.

43 Ọ si ha, Dèvid si kwa aṅa kpọ Ya Onye-nwe-ya nime Mọ Nsọ, si,

44 Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,

Nọdu ala n’aka-nrim,

Rue mb͕e M’gētiye ndi-iro-Gi n’okpuru ukwu-Gi abua?

45 Ya mere, ọ buru na Devid akpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si aṅa buru Nwa-ya?

46 Ma ọ dighi onye ọ bula puru iza Ya okwu, ọ dighi kwa onye nwere anya-ike site n’ubọchi ahu iju Ya ajuju ọzọ.

Categories
MATIU

MATIU 23

1 Mb͕e ahu Jisus gwara ìgwè madu nile na ndi nēso uzọ-Ya okwu,

2 si, N’oche Moses ka ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nọduru:

3 ya mere, ihe nile, ka ha ra, bú nke ha gāsi unu me, menu ihe ndia, debe kwa ha: ma unu emela dika ọlu nile ha si di; n’ihi na ha nēkwu, ma ha adighi-eme.

4 Ma ha nēke ibu di arọ́ di kwa ike obubu, tukwasi ha n’ubu madu; ma ha onwe-ha achọghi iji otù nkpisi-aka-ha wezuga ha.

5 Ma ọlu-ha nile ka ha nālu ka madu we kiri ha: n’ihi na ha nēme ka phylactery nile ha di obosara, me kwa ka ọnu-ọnu uwe-ha di uku,

6 ha nāhu kwa isi ọnọdu nile n’oriri nile unu n’anya, na isi oche nile n’ulo-nzukọ-unu,

7 na ekele n’ọma-ahia nile unu, na ka madu nākpọ ha, Rabai.

8 Ma ka aghara ikpọ unu onwe-unu, Rabai: n’ihi na otù Onye bu Onye-ozizí-unu, ma unu onwe-unu nile bu umu-nna.

9 Unu akpọ-kwa-la onye ọ bula nna-unu n’elu uwa: n’ihi na otù Onye bu Nna-unu, Ya bu Onye nke elu-igwe.

10 Ka aghara kwa ikpọ unu ndi-ndú, n’ihi na otù Onye bu Onye-ndú-unu, Ya bu Kraist ahu.

11 Ma onye dikariri uku n’etiti unu gābu onye nējere unu ozi.

12 Ma onye ọ bula nke gēweli onwe-ya elu, agēweda ya; onye ọ bula nke gēweda kwa onwe-ya, agēweli ya elu.

13 Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n’ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n’iru madu: n’ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.

14 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n’ihi na unu nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu unu: unu gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara okè kari ndi ọzọ.

15 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n’ihi na unu nējeghari n’oké osimiri na ala kpọrọ nku buruburu ka unu me otù onye ka o so uzọ-unu; ma mb͕e ọ ghọrọ otú ahu, unu nēme ya okpukpu abua nwa ọku ala-mọ kari onwe-unu.

16 Ahuhu gādiri unu, ndi-ndú ìsì, ndi si, Onye ọ bula nke gēji ulo nsọ Chineke ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ọla-edo nke ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ugwọ.

17 Ndi-nzuzu na ndi-ìsì: n’ihi na òle nke dikariri uku, ọla-edo ahu, ma-ọbu ulo nsọ nke doro ọla-edo ahu nsọ?

18 Unu si kwa, Onye ọ bula nke gēji ebe-ichu-àjà ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ihe-onyinye di n’elu ya ṅu iyí, o ji ugwọ.

19 Ndi-ìsì: n’ihi na òle nke ka uku, ihe-onyinye, ma-ọbu ebe-ichu-àjà nke nēdo ihe-onyinye ahu nsọ?

20 Ya mere, onye ji ebe-ichu-àjà ahu ṅu iyí, o ji ya, na ihe nile di n’elu ya, ṅu iyí.

21 Onye ji kwa ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ya, na Onye bi nime ya, ṅu iyí.

22 Onye ji kwa elu-igwe ṅu iyí, o ji oche-eze Chineke, na Onye nọduru n’elu ya, ṅu iyí.

23 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n’ihi na unu nēnye otù uzọ n’uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ na anise na cummin, unu arapuwo kwa ihe ka arọ́ n’iwu, bú ikpé, na ebere, na okwukwe: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.

24 Ndi-ndú ìsì, ndi nāzapu anwu ntà, ma unu nēloda camel.

25 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n’ihi na unu nēme ka azu iko na afere di ọcha, ma n’ime ha juputara site n’ipunara madu ihe na ejideghi-onwe-unu.

26 Gi Farisi kpuru ìsì, buru uzọ me ka ime iko na afere di ọcha, ka azu-ha we ghọ kwa ọcha.

27 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n’ihi na unu yiri ili eteworo nzu, nke nēgosi onwe-ha dika ihe ọma n’ìhè, ma n’ime ha juputara n’ọkpukpu nke ndi nwuru anwu, na adighi-ọcha nile.

28 Otú a unu onwe-unu nēgosi kwa onwe-unu nye madu n’ìhè dika ndi ezi omume, ma n’ime unu juputara n’iru-abua na ihe nēmebi iwu.

29 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n’ihi na unu nēwu ílì ndi-amuma, nēdozi kwa ebe anēlì ndi ezi omume,

30 unu nāsi kwa, Ọ buru na ayi nọri n’ubọchi nna-ayi-hà, ayi agaghi-eso ha n’inwekọ ọbara ndi-amuma.

31 Ya mere unu nāb͕a àmà megide onwe-unu, na unu bu umu nke ndi b͕uru ndi-amuma.

32 Unu onwe-unu mezu kwa ihe-ọtùtù nke nna-unu-hà.

33 Unu agwọ, unu aju-ala, ùnu gēsi aṅa b͕anari ikpé nke ọku ala-mọ?

34 N’ihi nka, le, Mu onwem nēzitere unu ndi-amuma, na ndi-amam-ihe, na ndi-ode-akwukwọ: ufọdu nime ha ka unu gēb͕u, kpọgide kwa ha n’obe; ufọdu nime ha ka unu gāpia kwa ihe n’ulo-nzukọ-unu, si kwa n’otù obodo nēsob͕u ha ga obodo ọzọ:

35 ka ọbara ndi ezi omume nile awusiworo n’elu uwa we biakwasi unu, site n’ọbara Ebel onye ezi omume ahu rue ọbara Zakaraia nwa Barakaia, onye unu b͕uru n’ab͕ata ulo nsọ na ebe-ichu-àjà-unu.

36 N’ezie asim unu, ihe ndia nile gābiakwasi ọb͕ọ a.

37 Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M’chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n’okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!

38 Le, anārapuru unu ulo-unu ka ọ tọb͕ọrọ n’efu.

39 N’ihi na asim unu, Unu agaghi-ahum ọzọ site n’ub͕u a ma-ọli, rue mb͕e unu gāsi, Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n’aha Onye-nwe-ayi.

Categories
MATIU

MATIU 24

1 Jisus we si n’ulo uku Chineke pua, we nāga n’uzọ-Ya; ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya igosi Ya owuwu-ulo nile nke ulo uku Chineke.

2 Ma Ọ zara, si ha, Ùnu ahughi ihe ndia nile? n’ezie asim unu, Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n’ebe a n’elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n’ala.

3 Mb͕e Ọ nānọdu n’elu ugwu Olive, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a?

4 Jisus we za, si ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu.

5 N’ihi na ọtutu madu gābia n’aham, si, Mu onwem bu Kraist ahu; ha gēduhie kwa ọtutu madu.

6 Unu gāje inu okwu agha di iche iche na akukọ agha di iche iche: lenu ka unu ghara itu ujọ: n’ihi na ihe ndia aghaghi iputa; ma ọgwugwu ihe nile akērughi.

7 N’ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: oké unwu na ala-ọma-jijiji gādi kwa n’ebe di iche iche.

8 Ma ihe ndia nile bu nmalite ihe-nb͕u.

9 Mb͕e ahu ka ha gārara unu nye na nkpab͕u, ha gēb͕u kwa unu: mba nile gākpọ kwa unu asì n’ihi aham.

10 Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n’ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì.

11 Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu.

12 N’ihi na ihe nēmebi iwu gāba uba, ihu-n’anya nke ndi ka n’etiti madu gāju kwa oyi.

13 Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.

14 Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n’elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mb͕e ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa.

15 Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n’efu, nke ekwuru site n’ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n’ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche),

16 mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n’ugwu:

17 onye nọ n’elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n’ulo-ya:

18 onye nọ kwa n’ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe uku ya.

19 Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.

20 Ma kpenu ekpere ka nb͕apu-unu ghara idi na mb͕e oyi, ma-ọbu n’ubọchi-izu-ike:

21 n’ihi na mb͕e ahu ka nkpab͕u uku gādi, nke ihe dika ya akādighi site na nmalite uwa rue mb͕e a, é-è, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.

22 Ọ buru kwa na emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n’ihi ndi arọputara agēme ka ubọchi ahu di nkpirikpi.

23 Mb͕e ahu ọ buru na onye ọ bula gāsi unu, Le, Kraist nọ n’ebe a, ma-ọbu, N’ebe a; unu ekwela.

24 N’ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.

25 Le, agwawom unu mb͕e akēmeghi ya.

26 Ya mere, ọ buru na ha gāsi unu, Le, Ọ nọ n’ọhia; unu apula: Le, Ọ nọ n’ime-ulo; unu ekwela.

27 N’ihi na dika àmùmà si n’Ọwuwa-anyanwu puta, gosi kwa onwe-ya rue Ọdida-anyanwu; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.

28 Ebe ọ bula ozu di, n’ebe ahu ka udele gēzukọ.

29 Ma ngwa ngwa, mb͕e nkpab͕u mb͕e ahu gasiri, anyanwu gāb͕a ọchichiri, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya, kpakpando nile gāda kwa site n’elu-igwe, agēme kwa ka ike nile nke elu-igwe me nkpatu:

30 mb͕e ahu ka ihe-iriba-ama nke Nwa nke madu gāputa kwa ìhè n’elu-igwe: mb͕e ahu ka ebo nile nke uwa gēti kwa aka n’obi, ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n’elu igwe-oji nile nke elu-igwe n’ike na oké ebube.

31 Ọ gēwere kwa opì uku zipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gēme kwa ka ndi nke Ya arọputara si n’ifufe anọ zukọ, site n’otù nsọtu elu-igwe rue nsọtu-ya ọzọ.

32 Ma site n’aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso;

33 otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia nile, maranu na Ọ nọ nso, n’ọnu-uzọ.

34 N’ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme.

35 Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.

36 Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi na oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amataghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara.

37 Ọ bu kwa dika ubọchi Noa diri, otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.

38 N’ihi na dika ha nọ na mb͕e ahu nke bū oké iju-miri ahu uzọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nālu nwunye, nēnye kwa n’ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n’ub͕ọ-ya,

39 ha amaghi kwa rue mb͕e oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.

40 Mb͕e ahu madu abua gānọ n’ubì; ewere otù, rapu kwa otù:

41 ndinyom abua ganēgwe nri na nkume-igwe-nri; ewere otù, rapu kwa otù.

42 Ya mere, nēchenu nche: n’ihi na unu amataghi ubọchi Onye-nwe-unu gābia.

43 Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge nche onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-ekwe kwa ka egwupú ulo-ya.

44 N’ihi nka unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.

45 Ònye kwa bu orù ahu kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya mere onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha ihe eji azù ha n’oge-ya?

46 Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a.

47 N’ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere.

48 Ma ọ buru na orù ọjọ ahu gāsi n’obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya;

49 ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndi-orù-ibe-ya aka, so kwa ndi nāṅubiga manya ókè nēri nāṅu kwa;

50 onye-nwe orù ahu gābia n’ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n’oge hour ọ nāmaghi,

51 ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, kè òkè nye ya n’etiti ndi-iru-abua: n’ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

Categories
MATIU

MATIU 25

1 Mb͕e ahu agēji ala-eze elu-igwe tuyere umu-ab͕ọghọ iri, ndi chiri ọwa-ha, pua izute onye nālu nwunye ọhu.

2 Ma ise nime ha bu ndi-nzuzu, ise bu kwa ndi nwere uche.

3 N’ihi na ndi-nzuzu ahu, mb͕e ha chiri ọwa-ha, ha ejighi manu n’aka-ha:

4 ma ndi ahu nwere uche ji manu n’aria-ha tiyere ọwa-ha.

5 Ma mb͕e onye nālu nwunye ọhu nānọ ọdù di anya, ha nile rubere ura we raru.

6 Ma n’etiti abali iti-nkpu dara, Le, onye nālu nwunye ọhu! Putanu izute ya.

7 Mb͕e ahu umu-ab͕ọghọ ahu nile biliri, we dozie ọwa-ha.

8 Ndi-nzuzu we si ndi nwere uche, Nye ayi ufọdu na manu-unu; n’ihi na ọwa-ayi nānyu anyu.

9 Ma ndi nwere uche zara, si, É-è, eleghi anya ọ gaghi-ezuru ayi na unu: kama jekurunu ndi nēre, zuru nye onwe-unu.

10 Ma mb͕e ha nēje izú, onye nālu nwunye ọhu biara; ndi edoziworo we so ya ba n’oriri ọlulu-nwunye: ewe mechie uzọ.

11 Emesia umu-ab͕ọghọ fọduru bia kwa, nāsi, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ.

12 Ma ọ zara, si, N’ezie asim unu, amataghm unu.

13 Ya mere, nēchenu nche, n’ihi na unu amataghi ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu.

14 N’ihi na ọ di ka mb͕e madu, mb͕e ọ gaje inọdu n’ala ndi ọzọ, ọ kpọrọ ndi-orù nke aka ya, rara ihe nile o nwere nye n’aka-ha.

15 Otù ka ọ nyere talent ise, nke-ọzọ talent abua, nke-ọzọ otù talent; o nye onye ọ bula dika ike nke aka ya ra; o we je inọdu n’ala ndi ọzọ.

16 Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ.

17 Otú ahu onye nara talent abua ahu rita-kwa-ra talent abua ọzọ.

18 Ma onye nara otù talent ahu jere gwu ala, zobe ego onye-nwe-ya.

19 Ma mb͕e ogologo oge gasiri onye-nwe ndi-orù ahu bia, ya na ha we piazi.

20 Onye ahu nke nara talent ise we biakute ya weta talent ise ọzọ, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent ise nyem n’aka: le, eritaram talent ise ọzọ n’urù.

21 Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi: i kwesiri ka atukwasi gi obi n’umu ihe ole-na-ole, m’gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n’ọṅù nke onye-nwe-gi.

22 Onye nara talent abua ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent abua nyem n’aka: le, eritaram talent abua ọzọ n’urù.

23 Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi; i kwesiri ka atukwasi gi obi n’umu ihe ole-na-ole, m’gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n’ọṅù nke onye-nwe-gi.

24 Onye narari otù talent ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, amaram i na i bu madu aka ike, nēwe ihe ubi n’ebe i nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n’ebe i nāfuchagh:

25 m’we tua egwu, we je zobe talent nke gi n’ala: le, i nwere nke gi.

26 Ma onye-nwe-ya zara, si ya, Ajọ orù nke di ume-ngwu, i matara na anamewe ihe ubi n’ebe m’nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n’ebe m’nāfuchaghi;

27 ya mere, ọ di gi nkpà iwere egom tiye n’aka ndi nāb͕anwe ego, mb͕e m’biara mu onwem gānaghachi kwa nkem, ya na uma.

28 Ya mere, napunu ya talent ahu, were kwa ya nye onye ahu nke nwere talent iri ahu.

29 N’ihi na onye ọ bula nke nwere ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma site n’aka onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

30 Tupu-kwa-nu orù a nābaghi n’ihe n’ọchichiri nke èzí: n’ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

31 Ma mb͕e ọ bula Nwa nke madu gābia n’ebube-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi nile, mb͕e ahu ka Ọ gānọkwasi n’oche-eze nke ebube-Ya:

32 ma n’iru Ya ka agēme ka mba nile zukọ: Ọ gēkewaputa kwa ha, otù n’aru ibe-ya, dika onye nāzù aturu nēkewaputa aturu n’umu-ewu:

33 Ọ gēdebe kwa aturu n’aka-nri-Ya, ma umu-ewu n’aka-ekpe.

34 Mb͕e ahu Eze ahu gāsi ndi nọ n’aka-nri-Ya, Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa:

35 n’ihi na agu gurum, unu we nyem ihe M’gēri: akpiri kpọrọm nku, unu we kuru miri nyem: abum ọbìa, unu we kpọbatam;

36 ab͕aram ọtọ, unu we b͕okwasim ákwà: aru adighm ike, unu we letam: anọm n’ulo-nkpọrọ, unu we biakutem.

37 Mb͕e ahu ndi ezi omume ahu gāza Ya, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ayi we zùa Gi? ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ayi we kuru miri nye Gi?

38 Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka I bu ọbìa, ayi we kpọbata Gi? ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ayi we b͕okwasi Gi ákwà?

39 Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka aru nādighi ike, ma-ọbu n’ulo-nkpọrọ, ayi we biakute Gi?

40 Eze ahu gāza kwa, si ha, N’ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.

41 Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n’aka-ekpe-Ya, Puanu n’irum, ndi anābu ọnu, ga n’ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya:

42 n’ihi na agu gurum, ma unu enyeghm ihe M’gēri: akpiri kpọrọm nku, ma unu ekughi miri nyem:

43 abum ọbìa, ma unu akpọbataghm; ab͕aram ọtọ, ma unu eb͕okwasighm ákwà; aru adighm ike, anọkwam n’ulo-nkpọrọ, ma unu eletaghm.

44 Mb͕e ahu ndi ahu gāza kwa, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ma-ọbu ka I bu ọbìa, ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ma-ọbu ka aru nādighi Gi ike, ma-ọbu ka I nọ n’ulo-nkpọrọ, ma ayi ejereghi Gi ozi?

45 Mb͕e ahu Ọ gāza ha, si, N’ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu nēmeghi ya nye otù onye nime ndia dikarisiri ntà, Mu ka unu nēmeghi ya nye.

46 Ndia gāpu je ba n’ahuhu-nmehie ebighi-ebi: ma ndi ezi omume gābà na ndu ebighi-ebi.

Categories
MATIU

MATIU 26

1 O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia nile, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,

2 Unu matara na mb͕e ubọchi abua gasiri ememe ngabiga nābia, arara kwa Nwa nke madu nye ka akpọgide Ya n’obe.

3 Mb͕e ahu ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ n’obí onye-isi-nchu-àjà, onye anākpọ Kaiafas;

4 ha we b͕akọ ìzù ka ha we were aghughọ jide Jisus, b͕ue Ya.

5 Ma ha siri, Ọ bughi n’ememe a, ka ùzù we ghara iputa n’etiti ndi-Ju.

6 Ma mb͕e Jisus nọ na Betani, n’ulo Saimon onye-ekpenta,

7 otù nwanyi biakutere Ya nke nēji ite alabaster, nke manu-otite di oké ọnu-ahia nke-uku di ya, o we wusa manu-otite ahu n’isi-Ya, mb͕e Ọ nọduru na nri.

8 Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, iwe were ha nke-uku, ha si, Èji ila-n’iyì nka me gini?

9 N’ihi na apuru ire manu-otite a oké ọnu-ahia, we nye ndi-ob͕eye.

10 Ma mb͕e Jisus mara ya, Ọ si ha, Gini mere unu nēsob͕u nwanyi a? n’ihi na ọ luru ọlu ọma n’arum.

11 N’ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n’etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.

12 N’ihi na n’iwusi manu-otite a n’arum, o mere ya ka o we doziem n’olìlì.

13 N’ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n’uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya.

14 Mb͕e ahu otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, onye anākpọ Judas Iskariot, jekuru ndi-isi-nchu-àjà,

15 si, Gini ka unu nāchọ inyem, mu onwem gārara kwa Ya nye n’aka-unu? Ha we tù orú ego ọla-ọcha na iri nye ya.

16 Site na mb͕e ahu o we chọ oghere irara Ya nye.

17 Ma n’ubọchi mbu nke achicha ekoghi-eko ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus, si, Òle ebe I nāchọ ka ayi doziere Gi ka I we rie oriri ngabiga?

18 O we si, Jenu n’obodo a jekuru onye di otú a, si ya, Onye-ozizí si, Ogem di nso; Mu na ndi nēso uzọm nēme ememe ngabiga n’ulo-gi.

19 Ndi nēso uzọ-Ya we me dika Jisus nyere ha iwu; ha we dozie ememe ngabiga.

20 Ma mb͕e o ruru anyasi, Ya na ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya nọduru na nri;

21 mb͕e ha nēri ihe, Ọ si, N’ezie asim unu, na otù onye si n’etiti unu puta gāraram nye.

22 O we wuta ha ri nne, ha nile n’otù n’otù we malite isi Ya, Ọ̀ bu mu, Onye-nwe-ayi?

23 Ma Ọ zara, si, Onye nke Mu na ya sukọrọ aka n’afere, onye ahu gāraram nye.

24 Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ bayere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n’aka-ya rara Nwa nke madu nye. Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.

25 Judas, onye nārara ya nye, we za, si, Ọ̀ bu mu, Rabai? Ọ si ya, Gi onwe-gi kwuru.

26 Mb͕e ha nēri ihe, Jisus we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya; O we nye ndi nēso uzọ-Ya, si, Naranu, rie; nka bu arum.

27 O we nara iko, kele kwa, we nye ha, si, Unu nile ṅua nime ya;

28 n’ihi na nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusiri ọtutu madu ka ewe b͕aghara nmehie.

29 Ma asim unu, M’gaghi-aṅu ma-ọli site n’ub͕u a n’ihe a si n’osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e Mu na unu gāṅu ya ọhu n’ala-eze Nnam.

30 Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.

31 Mb͕e ahu Jisus si ha, Agēme ka unu onwe-unu nile ma n’ọnyà n’arum abali ta: n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, M’gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu nke ìgwè aturu-ya.

32 Ma mb͕e emere ka M’si n’ọnwu bilie, M’gēburu unu uzọ ga Galili.

33 Ma Pita zara, si Ya, Ọ buru na agēme madu nile ka ha ma n’ọnyà n’aru Gi, agaghi-eme ka mu onwem ma n’ọnyà mb͕e ọ bula.

34 Jisus si ya, N’ezie asim i, na n’abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá, i gāgọnarim ub͕ò atọ.

35 Pita si Ya, Ọ buru na ọ di nkpà ọbuná ka m’so Gi nwua, agaghm-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ndi ahu nile ndi nēso uzọ-Ya kwuru.

36 Mb͕e ahu Jisus na ha biarue ogige anākpọ Getsemane, Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n’ebe a, rue mb͕e M’gēje n’ebe ahu kpe ekpere.

37 O we kuru Pita na umu Zebedi abua tiyere Onwe-ya, o we malite iwuta Ya n’obi, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri.

38 Mb͕e ahu Ọ si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n’ebe a, som nēche nche.

39 O we ga n’iru nke-ntà, da kpuchiè iru-Ya n’ala, we kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na ọ gēkwe me, ka iko a gabigam: ma ọ bughi dika Mu onwem nāchọ, kama dika Gi onwe-gi nāchọ.

40 O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Ùnu di otú a nēnweghi ike isom che nche otù oge hour?

41 Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n’ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n’ezie, ma anu-aru adighi ike.

42 O we rapu ha je kwa ọzọ nke ub͕ò abua, kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na nka apughi igabiga, ma ọ buru na aṅughm ya, ka eme ihe I nāchọ.

43 O we bia kwa ọzọ, hu ha ka ha nāraru ura, n’ihi na anya-ha di arọ́.

44 O we rapu ha ọzọ, je, kpe ekpere nke ub͕ò atọ, nēkwu otù okwu ahu ọzọ.

45 Mb͕e ahu Ọ biakute ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Nārarunu ura site n’ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: le, oge hour nkem di nso, anārara Nwa nke madu nye n’aka ndi-nmehie.

46 Bilienu, ka ayi je: le, onye nāraram nye nọ nso.

47 Mb͕e Ọ kpu okwu n’ọnu, le, Judas, otù onye n’etiti ndi-ozi iri na abua ahu, we bia, ya na oké ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n’ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju nọ.

48 Ma onye nārara Ya nye nyere ha ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m’gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya: jidenu Ya.

49 Ngwa ngwa ọ biakutere Jisus, si, Ekele, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku.

50 Jisus we si ya, Eyim, me ihe i biara ime. Mb͕e ahu ha biakutere Ya, we tukwasi Jisus aka, jide Ya.

51 Ma le, otù onye nime ndi ha na Jisus nọ setiri aka-ya, miputa mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-aja mma, bipu nti-ya.

52 Mb͕e ahu Jisus si ya, Mighachi mma-agha-gi n’ọnọdu-ya: n’ihi na madu nile ndi were mma-agha gāla n’iyì site na mma-agha.

53 Ma-ọbu i nēchè na apughm iriọ Nnam, Ọ gēzite-kwa-ram ọbuná ub͕u a kari legion iri na abua nime ndi-mọ-ozi?

54 Ihe edeworo n’akwukwọ nsọ gēsi kwa aṅa mezu, na ọ ghaghi ime otú a?

55 N’oge hour ahu Jisus siri ìgwè madu ahu, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Kwa-ubọchi M’nọduru n’ulo uku Chineke nēzí ihe, ma unu ejideghm.

56 Ma emewo ihe a dum, ka ihe nile ndi-amuma dere n’akwukwọ we mezu. Mb͕e ahu ndi nile nēso uzọ-Ya rapuru Ya, b͕alaga.

57 Ma ndi jidere Jisus si n’ebe ahu duru Ya je rue ulo Kaiafas onye-isi-nchu-àjà, ebe ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye zukọrọ.

58 Ma Pita soro Ya n’ebe di anya, rue obí onye-isi-nchu-àjà, o we ba nime, nọdu n’etiti ndi nēje ozi, ka ọ hu ọgwugwu-ya.

59 Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà ugha imegide Jisus, ka ha we me ka Ọ nwua;

60 ma ha achọtaghi, ọ bu ezie na ọtutu ndi-àmà ugha biara. Ma emesia abua biara,

61 si, Nwoke a siri, Apurum ikwatu ulo nsọ a nke Chineke, wu kwa ya n’ubọchi atọ.

62 Onye-isi-nchu-àjà we bilie, si Ya, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi?

63 Ma Jisus kpuchiri ọnu. Onye-isi-nchu-àjà we si Ya, Ewerem Chineke di ndu b͕a Gi iyí, ka I gwa ayi ma Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke.

64 Jisus si ya, Gi onwe-gi kwuru: otú ọ di, asim unu, Site n’ub͕u a unu gāhu Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n’aka-nri nke ike, nābia kwa n’elu igwe-oji nile nke elu-igwe.

65 Mb͕e ahu onye-isi-nchu-àjà dọwara uwe-ya nile, si, O kwuluru Chineke: ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? le, ub͕u a ka unu nuru nkwulu ahu:

66 gini bu uche-unu? Ha we za, si, O kwesiri inwu ọnwu.

67 Mb͕e ahu ha busara Ya ọnu-miri n’iru, ti kwa Ya aka: ufọdu we pia Ya ihe,

68 si, Buru ayi amuma, Kraist: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka?

69 Ma Pita nọduru n’èzí n’obí: otù nwa-ab͕ọghọ we biakute ya, si, Gi onwe-gi na Jisus Onye Galili nọ-kwa-ra.

70 Ma ọ gọrọ n’iru ha nile, si, Amataghm ihe i nēkwu.

71 Ma mb͕e ọ puru je n’uzọ-nbata, nwa-ab͕ọghọ ọzọ huru ya, ọ si ndi nọ n’ebe ahu, Nwoke a na Jisus Onye Nazaret nọ-kwa-ra.

72 O were iṅu-iyí gọ kwa ọzọ, si, Amataghm Nwoke a.

73 Ma mb͕e nwa oge gasiri ndi guzoro nso biakutere Pita, si ya, N’ezie gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha; n’ihi na okwu-ọnu-gi nēweputa gi n’ìhè.

74 Mb͕e ahu ọ malitere idu ikwù na iṅu iyí, si, Amataghm Nwoke a. Ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa ákwá.

75 Pita we cheta okwu Jisus kwururi, si, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi, i gāgọnarim ub͕ò atọ. O we pua, kwa ákwá nke-uku.

Categories
MATIU

MATIU 27

1 Ma mb͕e o ruru ututu, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nile nke ndi-Ju b͕ara ìzù megide Jisus ime ka Ọ nwua:

2 ha we ke Ya ab͕u, dupu Ya, rara Ya nye n’aka Pailat onye-isi.

3 Mb͕e ahu Judas, onye rara Ya nye, mb͕e ọ huru na amara Ya ikpé, ọ kwa uta, chighachi orú ego ọla-ọcha na iri ahu nye ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye,

4 si, Emehierem n’irara ọbara Onye ikpé nāmaghi nye. Ma ha siri, Òle nke diri ayi nime ya? gi onwe-gi le nke ahu.

5 O we tubà ego ọla-ọcha ahu nile n’ulo nsọ, wezuga onwe-ya; o we je, kwub͕u onwe-ya.

6 Ndi-isi-nchu-àjà we nara ego ọla-ọcha nile, si, O zighi ezi n’iwu itubà ha n’ebe anēdebe ihe enyere Chineke, ebe ọ bu ọnu-ahia ọbara.

7 Ha we b͕a ìzù, chiri ha zuta ubi ọkpu-ite, ilì ndi-ọbìa.

8 N’ihi nka ka akpọrọ ubi ahu, Ubi ọbara, rue ta.

9 Mb͕e ahu okwu ekwuru site n’ọnu Jeremaia onye-amuma mezuru, si, Ha we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, bú ọnu-ahia nke Onye aruru ọnu-ahia-Ya, Onye ufọdu site na umu Israel ruru ọnu-ahia-Ya;

10 ha we nye ha iji zuru ubi ọkpu-ite, dika Onye-nwe-ayi nyerem iwu.

11 Ma Jisus guzoro n’iru onye-isi: onye-isi ahu we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? Jisus we si ya, Gi onwe-gi kwuru.

12 Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nēbo Ya ebubo, Ọ zaghi ihe ọ bula.

13 Mb͕e ahu Pailat si Ya, Ì nughi ka ọtutu ihe ha nāb͕a àmà megide Gi ra?

14 Ma Ọ zaghi ya, ọbuná rue otù okwu: ya mere na o juru onye-isi ahu anya nke-uku.

15 Ma n’ememe onye-isi nārapuru ọra ndi-Ju otù onye-nkpọrọ, onye ha nāchọ.

16 Ma mb͕e ahu ha nwere onye-nkpọrọ onye ọra madu mara, anākpọ Barabas.

17 Ya mere, mb͕e ha zukọrọ, Pailat si ha, Ònye ka unu nāchọ ka m’rapuru unu? Barabas, ma-ọbu Jisus Onye anākpọ Kraist?

18 N’ihi na ọ matara na ha rara Ya-ri nye n’ihi ekworo.

19 Mb͕e ọ nọkwasiri n’oche-ikpé, nwunye-ya zigara ya, si, Aka-gi adila n’okwu Onye ezi omume ahu: n’ihi na ahujurum ọtutu ihe anya na nrọ ta n’ihi Ya.

20 Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye rafuru ìgwè madu nile ka ha riọ ya Barabas, ma la Jisus n’iyì.

21 Ma onye-isi ahu zara, si ha, Ònye nime madu abua ahu ka unu nāchọ ka m’rapuru unu? Ha we si, Barabas.

22 Pailat si ha, Ọ̀ bu gini ka m’gēme kwa Jisus Onye anākpọ Kraist? Ha nile si, Ka akpọgide Ya n’obe.

23 O we si, É-è, n’ihi na Ò mere ihe ọjọ gini? Ma ha tibigara nkpu ókè, si, Ka akpọgide Ya n’obe.

24 Ma mb͕e Pailat huru na okwu-ya abaghi n’ihe ọ bula, kama na ùzù nāputa, o were miri, kwọ aka-ya abua n’iru ìgwè madu ahu, si, Ikpé ọbara Onye ezi omume a amaghm: unu onwe-unu le nke ahu.

25 Ndi-Ju nile we za, si, Ọbara-Ya di ayi n’isi, di kwa n’isi umu-ayi.

26 Mb͕e ahu ọ rapuru ha Barabas: ma ọ rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n’obe.

27 Mb͕e ahu ndi-agha nke onye-isi kuru Jisus tiyere onwe-ha ba na Pritoriọm, ha we me ka òtù-ha dum zukọ n’ebe Ọ nọ.

28 Ha we yipu uwe-Ya, yikwasi Ya uwe uhie.

29 Mb͕e ha kpasiri okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n’isi, nye kwa Ya amì n’aka-nri-Ya; ha we b͕ue ikperè n’iru Ya, me Ya ihe-ọchì, si, Ekele, Eze ndi-Ju!

30 Ha busa-kwa-ra Ya ọnu-miri, were kwa amì ahu nēti Ya n’isi.

31 Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ahu, yikwasi Ya uwe-Ya nile, dupuga Ya ikpọgide Ya n’obe.

32 Ma mb͕e ha nāputa, ha huru otù nwoke onye Sairini, aha-ya bu Saimon: onye ahu ka ha jidere ka o so ha, ka o we būru obe-Ya.

33 Mb͕e ha biara n’ebe anākpọ Gọlgọta, nke bu, Ebe okpokoro-isi,

34 ha we nye Ya manya-vine nke agwara òlùlù ka Ọ ṅua: ma mb͕e O deturu ya ire, Ọ chọghi ka Ọ ṅua.

35 Mb͕e ha kpọgidesiri Ya n’obe, ha kère uwe-Ya n’etiti ha, nēfe nzà: ka o wee mezuo bụ ihe si n’ọnụ onye amụma Pita, Ha nēkere onwe-ha uwem, n’elu bụ ihe m n’eyi n’aru ka ha nēfe kwa nza.

36 ha we nọdu nēche Ya n’ebe ahu.

37 Ha debe-kwa-ra n’elu isi-Ya ihe eboro Ya nke edeworo n’akwukwọ, si, ONYE A BU JISUS EZE NDI-JU.

38 Mb͕e ahu akpọgidere ndikom abua tiyere Ya, bú ndi nāpunara madu ihe, otù onye n’aka-nri-Ya, na otù onye n’aka-ekpe.

39 Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha,

40 nāsi kwa, Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n’ubọchi atọ, zọputa Onwe-gi: ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n’elu obe ridata.

41 Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nēme Ya ihe-ọchì, si,

42 Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. Ọ bu Eze Israel; ka O si n’elu obe ridata ub͕u a, ayi gēkwe kwa na Ya.

43 Ọ nātukwasi obi-Ya na Chineke; ka Ọ dọputa Ya ub͕u a, ọ buru na Ọ nāchọ Ya: n’ihi na Ọ siri, Abum Ọkpara Chineke.

44 Ndi ahu nāpunara madu ihe, ndi akpọgidere Ya na ha n’obe, nāta kwa Ya uta otù aka ahu.

45 Ma site n’oge hour nke-isi ọchichiri b͕ara n’ala ahu nile rue oge hour nke-iteghete.

46 Ma dika oge hour nke-iteghete Jisus were oké olu tie nkpu, si, Eli, Eli, lama sabaktani? nke bu, Chinekem, Chinekem, ọ̀ bu n’ihi gini ka I rapuru nání Mu?

47 Ufọdu n’etiti ndi guzoro n’ebe ahu, mb͕e ha nuru ya, ha we si, Elaija ka Nwoke a nākpọ.

48 Ngwa ngwa otù onye nime ha we b͕a ọsọ, were sponge, b͕aju ya na manya-vine b͕ara uka, tukwasi ya n’amì, nye Ya ka Ọ ṅua.

49 Ndi fọduru we si, Rapu; ka ayi hu ma Elaija nābia izọputa Ya.

50 Ma Jisus were oké olu ti nkpu ọzọ, we ra mọ-Ya nye Chineke.

51 Ma le, ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke b͕awara iberibe abua site n’elu rue ala; ala ma-kwa-ra jijiji; oké nkume b͕awa-kwa-ra;

52 ílì meghe-kwa-ra; ewe me ka aru ọtutu ndi di nsọ ndi raruri ura si n’ọnwu bilie;

53 ha we si n’ebe anēlì ozu puta mb͕e nbilite-n’ọnwu-Ya gasiri, we ba n’obodo nsọ, were onwe-ha gosi ọtutu madu.

54 Ma ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, na ndi ha na ya nọ nēche Jisus, mb͕e ha huru ala-ọma-jijiji ahu, na ihe nile emere, ha tua egwu ri nne, si, N’ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke.

55 Ọtutu ndinyom nọ kwa n’ebe ahu ndi nọ n’ebe di anya nēkiri, ndi si na Galili soro Jisus, nējere Ya ozi:

56 n’etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes na Joses, na nne umu Zebedi, nọ.

57 Ma mb͕e o ruru anyasi, otù ọgaranya, aha-ya bu Josef, onye ya onwe-ya bu kwa onye nēso uzọ Jisus, si n’Arimatia bia:

58 nwoke a jekuru Pailat, riọ aru Jisus. Mb͕e ahu Pailat nyere iwu ka ewere ya nye n’aka-ya.

59 Josef we būru aru ahu, ke ya n’ezi ákwà ọcha nēnwu enwu,

60 tọb͕ọ ya n’ílì ọhu nke aka ya, nke o gwuwarari n’oké nkume: o we kpọre otù nkume uku kwachie ọnu-uzọ ílì ahu, we la.

61 Ma Meri Magdalini na Meri ọzọ nọ n’ebe ahu, nānọdu na ncherita-iru ílì ahu.

62 Ma n’echi-ya, nke bu ubọchi so ubọchi Nkwadebe, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi zukọrọ jekuru Pailat,

63 si, Onye-nwe-ayi, ayi chetara na Onye-nduhie ahu siri, mb͕e Ọ nọ na ndu, Mb͕e ubọchi atọ gasiri M’gēsi n’ọnwu bilie.

64 Ya mere, nye iwu ka emechie ílì ahu si-ike rue ubọchi nke-atọ, ka ndi nēso uzọ-Ya ghara ibia zuru Ya la ma eleghi anya, we si ndi-Ju, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie: njehie ikpe-azu a gājọ kwa njọ kari nke-mbu.

65 Pailat siri ha, Unu nwere òtù ndi-nche: labanu, mechienu ya si-ike, dika unu matara.

66 Ha we ga, mechie ílì ahu si-ike, n’ika akàrà na nkume ahu, ha na òtù ndi-nche ahu yikọrọ.

Categories
MATIU

MATIU 28

1 Ma mb͕e ubọchi-izu-ike nāgwu, mb͕e chi ubọchi mbu n’ízù ubọchi asa nābọ, Meri Magdalini na Meri ọzọ biara ile ílì ahu.

2 Ma le, ala-ọma-jijiji uku dara; n’ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi si n’elu-igwe ridata, bia rue, bupu nkume ahu, we nọkwasi ya.

3 Oyiyi-ya di ka àmùmà, uwe-ya nācha kwa ucha dika snow:

4 site n’egwu ya ndi-nche mara jijiji, bia di ka ndi nwuru anwu.

5 Ma mọ-ozi ahu zara, si ndinyom ahu, Unu onwe-unu atula egwu: n’ihi na amatawom na unu nāchọ Jisus, Onye akpọgideworo n’obe.

6 Ọ nọghi n’ebe a; n’ihi na emere ka O si n’ọnwu bilie, dika O kwuru. Bianu, le ebe Ọ tọb͕ọrọ.

7 Ga-kwa-nu ọsọsọ, si ndi nēso uzọ-Ya, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; ma le, O buru unu uzọ ga Galili; n’ebe ahu ka unu gāhu Ya: le, agwawom unu.

8 Ha we were egwu na oké ọṅù la ọsọsọ site n’ílì ahu, b͕a kwa ọsọ ikọrọ ndi nēso uzọ-Ya akukọ a.

9 Ma le, Jisus zutere ha, si, Ṅurianu ọṅu. Ha we bia jide ukwu-Ya abua, kpọ isi ala nye Ya.

10 Mb͕e ahu Jisus si ha, Unu atula egwu: jenu kọrọ umu-nnam ka ha je Galili, n’ebe ahu ka ha gāhukwam.

11 Ma mb͕e ha nāga, le, ufọdu nime òtù ndi-nche batara n’obodo ahu, kọrọ ndi-isi-nchu-àjà ihe nile mere.

12 Mb͕e ha na ndi-okenye zukọrọ, b͕a kwa ìzù, ha we nye ndi-agha ahu ego riri nne,

13 si, Sinu, Ndi nēso uzọ-Ya biara n’abali, zuru Ya n’ori mb͕e ayi nāraru ura.

14 Ọ buru kwa na nka ruru nti onye-isi, ayi onwe-ayi gārafu ya, me ka unu ghara icheb͕u onwe-unu.

15 Ha we nara ego ahu, me dika eziri ha: ewe b͕asa okwu a n’etiti ndi-Ju, rue ta.

16 Ma ndikom iri na otù ahu ndi nēso uzọ-Ya gara Galili, rue ugwu ebe Jisus gwara ha.

17 Mb͕e ha huru Ya, ha we kpọ isi ala nye Ya: ma ufọdu nwere obi abua.

18 Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n’elu-igwe na n’elu uwa nyem.

19 Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ:

20 nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M’nyere unu n’iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.