Categories
MATIU

MATIU 11

1 O rue, mb͕e Jisus nyebìri ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya iwu, O si n’ebe ahu pua izí ihe na ikwusa n’obodo nile ha.

2 Ma mb͕e Jọn nuru n’ulo-nkpọrọ ọlu nile nke Kraist ahu, o ziga ozi site n’aka ndi nēso uzọ-ya,

3 si Ya, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye di iche?

4 Jisus we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu nānu na nke unu nāhu:

5 ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi-ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n’ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma.

6 Ngọzi nādi-kwa-ra onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n’ọnyà n’arum.

7 Ma mb͕e ndia nāla, Jisus malitere igwa ìgwè madu nile okwu bayere Jọn, si, Ọ̀ bu gini ka unu puru je n’ọhia ka unu kiri? àmì nke nēme nkpatu site n’ifufe?

8 Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ǹwoke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi uwe di biali-biali nọ n’ulo ndi-eze.

9 Ma gini mere unu ji pua? ìhu onye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku.

10 Nwoke a bu onye edeworo ihe n’akwukwọ nsọ bayere ya, si,

Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n’iru Gi,

Onye gēmezi uzọ-Gi n’iru Gi.

11 N’ezie asim unu, N’etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku: ma onye dikariri ntà n’ala-eze elu-igwe ka ya uku.

12 Site n’ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya.

13 N’ihi na ndi-amuma nile na iwu Chineke buru amuma rue ubọchi Jọn.

14 Ọ buru kwa na unu nāchọ inara ya nke-ọma, nwoke ahu bu Elaija, nke gaje ibia.

15 Onye nwere nti inu ihe, ya nu.

16 Ma M’gēji ọb͕ọ a tuyere gini? O yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n’ọma-ahia, ndi nākpọ ibe-ha òkù,

17 si, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi aka n’obi.

18 N’ihi na Jọn biara nērighi ihe-oriri nāṅughi kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, O nwere mọ ọjọ.

19 Nwa nke madu biara nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, eyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie! Agu-kwa-ra amam-ihe n’onye ezi omume site n’ọlu-ya nile.

20 Mb͕e ahu ka Ọ malitere ita obodo ahu uta, bú nke Ọ lukariri ọlu-Ya di ike nime ha, n’ihi na ha echègharighi.

21 Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n’ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n’oge di anya gara aga n’ákwà-nkpe na ntu.

22 Otú ọ di, asim unu, Taia na Saidon gānagide okwu n’ubọchi ikpé, kari unu.

23 Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? i gārida rue Hedis: n’ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Sọdọm nke aluru nime gi, ọ gānọgidewori rue ta.

24 Otú ọ di, asim unu, na ala Sọdọm gānagide okwu n’ubọchi ikpé kari gi.

25 N’oge ahu Jisus zara, si, Ekelem I, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu:

26 e, Nna, ekelem I na ọ di ezi nma otú a n’iru Gi.

27 Nnam rara ihe nile nyem n’aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.

28 Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n’ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike.

29 Nyaranu yoke nkem n’olu-unu, muta-kwa-nu ihe n’ọnum; n’ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n’obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu.

30 N’ihi na yoke nkem adighi-eb͕u nb͕u, ibum di kwa nfé.

Categories
MATIU

MATIU 12

1 N’oge ahu Jisus gara n’etiti ubi ọka n’ubọchi-izu-ike; ma agu nāgu ndi nēso uzọ-Ya, ha we malite ighọ oko ọka, na ita ya.

2 Ma ndi-Farisi, mb͕e ha huru ya, ha si Ya, Le, ndi nēso uzọ-Gi nēme ihe nēzighi ezi n’iwu ime n’ubọchi-izu-ike.

3 Ma Ọ siri ha, Ùnu agughi ihe Devid mere, mb͕e agu guru ya, na ndi soro ya;

4 otú ọ batara n’ulo Chineke, rie ob͕e achicha anēche n’iru Chineke, nke nēzighi ezi n’iwu ka o rie, ma-ọbu ndi so ya, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi?

5 Ma-ọbu ùnu agughi n’iwu, na ndi-nchu-àjà nēmeru ubọchi-izu-ike n’ulo uku Chineke n’ubọchi-izu-ike, ma adighi-ata ha uta?

6 Ma asim unu, na Onye di uku kari ulo Chineke nọ n’ebe a.

7 Ma ọ buru na unu marari ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà, unu agaghi-ekpeb͕u ndi adighi-ata ha uta.

8 N’ihi na Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.

9 O we si n’ebe ahu pua, ba n’ulo-nzukọ-ha:

10 ma le, otù nwoke nke nwere aka kpọnwuru akpọnwu. Ha we jua Ya, si, Ò ziri ezi n’iwu ime ka aru madu di ike n’ubọchi-izu-ike? ka ha we bo Ya ebubo.

11 ma Ọ siri ha, Òle madu gādi n’etiti unu, nke gēnwe otù aturu, ma ọ buru na aturu ahu adabà nime olùlù n’ubọchi-izu-ike, ọ̀ gaghi-ejide ya, dọgoputa ya?

12 Òle kwa ka ọ ra, bú otú ọnu-ahia madu kariri nke aturu oké ọnu! Ya mere o ziri ezi n’iwu ime ihe ọma n’ubọchi-izu-ike.

13 Mb͕e ahu Ọ si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya; ewe me ka aka-ya di nma, dika nke-ọzọ.

14 Ndi-Farisi we pua, b͕a izù imegide Ya, ka ha gēsi la Ya n’iyì.

15 Ma ebe Jisus mara ya, O si n’ebe ahu wezuga Onwe-ya: ọtutu madu we so Ya; O we me ka aru di ha nile ike,

16 O we dọ ha aka na nti ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè:

17 ka okwu ekwuru site n’ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,

18 Le, Onye nējerem ozi Onye M’rọputara;

Onye M’huru n’anya, Onye ihe-Ya di nkpuru-obim ezi nma:

M’gātukwasi Ya Mọ nkem,

Ọ gākọ-kwa-ra mba nile akukọ ikpé.

19 Ọ gaghi-alu ọ̀gù, Ọ gaghi-etisi kwa nkpu ike;

Ọ dighi kwa onye ọ bula gānu olu-Ya n’amá.

20 Ọ gaghi-akpaji ami apiara apia,

Ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nākwu anwuru-ọku,

Rue mb͕e Ọ gātupu ikpé-Ya rue na nmeri.

21 Ọ bu kwa n’aha-Ya ka mba nile gātukwasi obi.

22 Mb͕e ahu ekutara Ya otù onye mọ ọjọ ji, bú onye kpuru ìsì nke da-kwa-ra ob͕i: O we me ka aru-ya di ike, ya mere onye-ob͕i ahu kwuru okwu hu kwa uzọ.

23 Ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile n’aru, ha we si, Nwoke a, Ọ̀ gābu nwa Devid?

24 Ma mb͕e ndi-Farisi nuru ya, ha si, Nwoke a adighi-achupu ndi-mọ ọjọ, ma-ọbughi n’ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ahu.

25 Ma ebe Ọ matara ihe di ha n’obi Ọ si ha, Ala-eze ọ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n’efu; obodo ma-ọbu èzí-na-ulo ọ bula nke kewa-kwa-ra megide onwe-ya agaghi-eguzo:

26 Ọ buru kwa na Setan achupu Setan, o kewara megide onwe-ya; àla-eze-ya gēsi kwa aṅa guzo?

27 Ọ buru kwa na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n’ike Beelzebul, n’ìke onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n’ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.

28 Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n’ike Mọ nke Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru.

29 Ma-ọbu màdu gēsi aṅa pu ibà n’ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u? mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n’ulo-ya.

30 Onye nādighi n’akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.

31 N’ihi nka ka M’ji si unu, Agāb͕aghara madu nmehie na nkwulu ọ bula; ma agaghi-ab͕aghara nkwulu ekwuluru Mọ Nsọ.

32 Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya; ma onye ọ bula nke gēkwu megide Mọ Nsọ, agaghi-ab͕aghara ya, ọ bughi n’oge a, ọ bughi kwa n’oge nke gaje ibia.

33 Menu osisi ka ọ di nma, menu nkpuru-ya ka ọ di kwa nma; ma-ọbu menu osisi ka ọ buru osisi nābaghi n’ihe, menu nkpuru-ya ka ọ buru kwa nkpuru nābaghi n’ihe: n’ihi na amara osisi site na nkpuru-ya.

34 Umu nke aju-ala, ùnu gēsi aṅa pu ikwu ezi ihe, ebe unu bu ajọ madu? n’ihi na ọnu site n’ihe nke obi nwebigara ókè nēkwu okwu.

35 Ezi madu nēsi n’ezi àkù-ya atuputa ezi ihe: ajọ madu nēsi kwa n’ajọ àkù-ya atuputa ajọ ihe.

36 Ma asim unu, na okwu ọ bula madu gēkwu nke nābaghi n’ihe, ha gāza ajuju bayere ya n’ubọchi ikpé.

37 N’ihi na agēsite n’okwu-ọnu-gi nile gu gi n’onye ezi omume, agēsite kwa n’okwu-ọnu-gi nile kpeb͕u gi.

38 Mb͕e ahu ufọdu n’etiti ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi zara Ya, si, Onye-ozizí, ayi nāchọ ihu ihe-iriba-ama site n’aka-Gi.

39 Ma Ọ zara, si ha, Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona onye-amuma:

40 n’ihi na dika Jona nọrọ ubọchi atọ ehihie na abali n’afọ oké anu miri; otú a Nwa nke madu gānọ n’obi nke ala ubọchi atọ ehihie na abali.

41 Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n’ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n’ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n’ebe a.

42 Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ọb͕ọ a bilie n’ikpé ahu, ọ gāma kwa ya ikpé: n’ihi na o siri n’ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomon; ma le, Onye ka Solomon nọ n’ebe a.

43 Ma mb͕e ọ bula mọ nādighi ọcha siri n’aru madu pua, ọ nāgabiga n’ebe miri nādighi, nāchọ izu-ike, ma ọ dighi-achọta ya.

44 Mb͕e ahu ọ si, M’gālaghachi n’ulom ebe m’siri puta; mb͕e ọ biara, o we hu ya ka ọ tọb͕ọrọ n’efu, azachasia ya, dozisia ya.

45 Mb͕e ahu ọ ga, chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ tiyere onwe-ya, ha we bà biri n’ebe ahu: ọnọdu ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu. Otú a ka ọ gādi-kwa-ra ajọ ọb͕ọ a.

46 Mb͕e Ọ nọ nāgwa ìgwè madu nile okwu, le, nne-Ya na umu-nne-Ya guzoro n’èzí, nāchọ igwa Ya okwu.

47 Otù onye we si Ya, Le, nne-Gi na umu-nne-Gi nēguzo n’èzí, nāchọ igwa Gi okwu.

48 Ma Ọ zara, si onye gwara Ya, Ònye bu nnem? òle ndi bu kwa umu-nnem?

49 O we setipu aka-Ya n’ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, si, Le, nnem na umu-nnem!

50 N’ihi na onye ọ bula nke gēme ihe Nnam Nke bi n’elu-igwe nāchọ, onye ahu bu nwa-nnem nwoke, na nwa-nnem nwanyi, na nnem.

Categories
MATIU

MATIU 13

1 N’ubọchi ahu Jisus puru n’ulo, we nọdu n’usọ oké osimiri.

2 Oké ìgwè madu we zukọ n’ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n’ub͕ọ, nọdu ala; ìgwè madu ahu nile guzo-kwa-ra n’ótú.

3 O we gwa ha ọtutu okwu n’ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru;

4 mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n’akuku uzọ, anu-ufe we bia tùturie ha:

5 nkpuru ọzọ we da n’ebe nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne: ngwa ngwa ha we púlite, n’ihi na ha enweghi ájá di omimi:

6 ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n’ihi na ha enweghi nkpọrọgwu.

7 Nkpuru ọzọ we da n’elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha.

8 Nkpuru ọzọ we da n’ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.

9 Onye nwere nti, ya nu.

10 Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si Ya, N’ìhi gini ka I nāgwa ha okwu n’ilu?

11 O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu.

12 N’ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma onye ọ bula nke nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

13 N’ihi nka ka M’nāgwa ha okwu n’ilu; n’ihi na ha adighi-ahu n’ọhuhu, ha adighi-anu kwa n’ọnunu, ha adighi-anuta kwa.

14 Ma anēmezuru ha amuma nke Aisaia, nke si,

N’ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli;

N’ọhuhu unu gāhu kwa, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli:

15 N’ihi na obi ndi nka mara abuba,

Nti-ha kpọchi-kwa-ra,

Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha;

Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya,

Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe,

Ghara kwa iwere obi-ha ghọta,

Ghara kwa ichighari,

Ka M’ghara kwa ime ka aru di ha ike.

16 Ma ngọzi nādiri anya-unu, n’ihi na ha nāhu uzọ; na nti-unu, n’ihi na ha nānu ihe.

17 N’ihi na n’ezie asim unu, na agu guru ọtutu ndi-amuma na ndi ezi omume ihu ihe unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha.

18 Ya mere, unu onwe-unu nu ilu nke ọgha-nkpuru ahu.

19 Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n’obi-ya. Onye a bu nke aghara n’akuku uzọ.

20 Onye agha-kwa-ra n’ebe nkume ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu, ngwa ngwa o were ọṅù jide ya;

21 ma o nweghi nkpọrọgwu nime onwe-ya, kama ọ nānọ nwa oge; ma mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n’ihi okwu ahu, ngwa ngwa ọ ma n’ọnyà.

22 Onye agha-kwa-ra n’etiti ogwu ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu; ma ncheb͕u nke oge a na aghughọ nke àkù nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.

23 Onye agha-kwa-ra n’ala ahu di nma, madu a bu onye nānu okwu ahu, we ghọta ya; onye nāmi nkpuru n’ezie, miputa, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.

24 O were ilu ọzọ che n’iru ha, si, Ejiri ala-eze elu-igwe tuyere madu mb͕e ọ ghara nkpuru ọma n’ubi-ya:

25 ma mb͕e madu nāraru ura, onye-iro-ya biara we gha kwa ata n’etiti ọka, we la.

26 Ma mb͕e npute puru, we mia nkpuru, mb͕e ahu ata ahu puta-kwa-ra ìhè.

27 Ndi-orù nna-nwe-ulo ahu we biakute ya, si ya, Onye-nwe-ayi, i ghaghi nkpuru ọma n’ubi-gi? òle ebe kwa ka o si nwe ata?

28 Ọ si ha, Madu nke bu onye-iro mere nka. Ndi-orù-ya we si ya, Ì nāchọ kwa ka ayi je chikọputa ha?

29 Ma ọ si, É-è; ka unu we ghara iropu ha na ọka ma eleghi anya, mb͕e unu nāchikọputa ata.

30 Rapunu ha abua ka ha nābakọta uba rue owuwe-ihe-ubi: ma n’oge owuwe-ihe-ubi m’gāsi ndi nēwe ihe-ubi, Burunu uzọ chikọta ata ahu, ke kwa ha n’ùkwù ka unu rechapu ha ọku: ma kpokọtanu ọka ahu n’ọba nkem.

31 O were ilu ọzọ che n’iru ha, si, Ala-eze elu-igwe yiri nkpuru mustard, nke madu were, gha n’ubi-ya:

32 nke ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile; ma mb͕e ọ bara uba, o bùkari ihe nile anāku n’ubi, we ghọ osisi, nke mere ka anu-ufe nke elu-igwe bia nānọ n’alaka-ya.

33 Ọ turu ha ilu ọzọ, si, Ala-eze elu-igwe yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri.

34 Okwu nile ndia ka Jisus gwara ìgwè madu nile n’ilu; ma O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu ọ bula:

35 ka okwu ekwuru site n’ọnu onye-amuma we mezu, si,

M’gāsaghe ọnum n’itu ilu;

M’gēkwuwa ihe ezoworo ezo site na ntọ-ala uwa.

36 Mb͕e ahu Ọ rapuru ìgwè madu nile, we bà n’ulo-ha: ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si, Kọrọ ayi isi ilu ata di n’ubi ahu.

37 O we za, si, Onye nāgha nkpuru ọma ahu bu Nwa nke madu;

38 ubi ahu bu uwa; nkpuru ọma ahu, ndi ahu bu umu ala-eze elu-igwe; ata ahu bu umu ajọ onye ahu;

39 onye-iro ahu nke ghara ha bu ekwensu: owuwe-ihe-ubi bu ọgwugwu oge a; ndi ahu nēwe ihe-ubi bu ndi-mọ-ozi.

40 Ya mere dika anāchikọputa ata rechapu kwa ha n’ọku; otú a ka ọ gādi n’ọgwugwu oge a.

41 Nwa nke madu gēzipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gāchikọputa n’ala-eze-Ya ihe nile nēme ka ama n’ọnyà, na ndi nēme ihe nēmebi iwu,

42 ha gātubà kwa ha n’oké ọku ahu: n’ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

43 Mb͕e ahu ka ndi ezi omume gēnwupu dika anyanwu n’ala-eze nke Nna-ha. Onye nwere nti, ya nu.

44 Ala-eze elu-igwe yiri àkù ezoworo n’ubi; nke madu huru, zobe kwa; n’ọṅù-ya o we la, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ubi ahu.

45 Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri onye-ahia nāchọ pearl ọma:

46 ma mb͕e ọ huru otù pearl di oké ọnu-ahia, ọ je, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ya.

47 Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri oké úb͕ú awuyere nime oké osimiri, nke kpokọta-kwa-ra ufọdu n’aha azù nile di iche iche:

48 nke, mb͕e o juru, ha dọgotara ya n’ótú; ha we nọdu, chikọta azù di nma tiye nime ihe, ma ha tufuru nke nādighi nma.

49 Otú a ka ọ gādi n’ọgwugwu oge a: ndi-mọ-ozi gāputa, kewaputa ndi bu ajọ madu n’etiti ndi ezi omume,

50 ha gātubà kwa ha n’oké ọku ahu: n’ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

51 Ùnu aghọtawo ihe ndia nile? Ha si Ya, E.

52 O we si ha, N’ihi nka ode-akwukwọ ọ bula nke emere ka ọ buru onye nēso uzọ ala-eze elu-igwe, o yiri madu nke bu nna-nwe-ulo, onye nēsi n’àkù-ya atuputa ihe ọhu na ihe ochie.

53 O rue, mb͕e Jisus tubìri ilu ndia, O si n’ebe ahu zọlie.

54 O we bia n’ala nke aka Ya, nēzí ha ihe n’ulo-nzukọ-ha, nke mere ka ibobo nwua ha n’aru, ha we si, Òle ebe ka Nwoke a nwere amam-ihe a na ọlu ndia di ike?

55 Nwoke a, Ọ̀ bughi Nwa onye-ọ̀kà-ayi? àdighi-akpọ nne-Ya Meri? nà umu-nne-Ya ndikom, Jemes, na Josef, na Saimon, na Judas?

56 Na umu-nne-Ya ndinyom, hà nile anọghi n’etiti ayi? Òle ebe kwa Nwoke a nwere ihe ndia nile?

57 Ewe me ka ha ma n’ọnyà n’aru Ya. Ma Jisus siri ha, Onye-amuma abughi onye anādighi-asọpuru, ma-ọbughi n’ala nke aka ya, na n’ulo nke aka ya.

58 Ọ lughi kwa ọtutu ọlu di ike n’ebe ahu n’ihi ekweghi-ekwe-ha.

Categories
MATIU

MATIU 14

1 N’oge ahu Herod, bú tetrarch, nuru akukọ Jisus,

2 o we si ndi nējere ya ozi, Nwoke a bu Jọn Baptist; o siwo na ndi nwuru anwu bilie; n’ihi nka ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya.

3 N’ihi na Herod jidereri Jọn, we ke ya ab͕u, tiye ya n’ulo-nkpọrọ n’ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya.

4 N’ihi na Jọn nāsi ya, O zighi gi ezi n’iwu inwe ya dika nwunye.

5 Ọ bu ezie na ọ chọrọ ib͕u kwa ya, ma ọ turu egwu ọra ndi-Ju, n’ihi na ha guru ya n’onye-amuma.

6 Ma mb͕e ncheta ọmumu Herod ruru, nwa-nwanyi Herodias tere egwú n’etiti, o we tọ Herod utọ.

7 N’ihi ya o were iṅu-iyi kwe nkwa inye ya ihe ọ bula ọ gāriọ.

8 Ma ebe nne-ya kwaliri ya, ọ si, Nyem isi Jọn Baptist n’ọkwa n’ebe a.

9 O we wuta eze ahu n’obi: ma n’ihi iṅu-iyi-ya nile, na n’ihi ndi ya na ha nọduru na nri, o nyere iwu ka ewere ya nye ya;

10 o we ziga, bipu isi Jọn n’ulo-nkpọrọ.

11 Ewe bute isi-ya n’ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu: o we būru ya nye nne-ya.

12 Ndi nēso uzọ-ya we bia, būru ozu-ya, lì kwa ya; ha we je kọrọ Jisus.

13 Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n’ebe ahu wezuga Onwe-ya n’ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n’obodo ahu nile so Ya n’ukwu ala.

14 O we puta, hu oké ìgwè madu, O we nwe ọmiko n’aru ha, me ndi-nriaria-ha ka aru-ha di ike.

15 Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si, Ebe a bu ọhia, oge agawo kwa ub͕u a; zilaga ìgwè madu ndia, ka ha we je n’obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe-oriri.

16 Ma Jisus siri ha, Ọ dighi ha nkpà ka ha la; unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie.

17 Ha we si Ya, Ayi enweghi n’ebe a ma-ọbughi ob͕e achicha ise na azù abua.

18 O we si, Chita ha n’ebe a nyem.

19 O we gwa ìgwè madu nile ka ha nọdu n’elu ahihia; O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n’elu-igwe, gọzie ha, nyawaha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ob͕e achicha ahu, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile.

20 Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, nkata iri na abua juru.

21 Ma ndi riri ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri, nāgughi ndinyom na umu-ntakiri.

22 Ngwa ngwa O we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n’ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n’ofè ọzọ, rue mb͕e Ya onwe-ya gēzilaga ìgwè madu nile.

23 Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ rigoro n’elu ugwu ahu iche ikpe ekpere: ma mb͕e o ruru anyasi, nání Ya nọ n’ebe ahu.

24 Ma ub͕ọ ahu di n’etiti oké osimiri ub͕u a, ebili-miri nēmekpa kwa ya aru; n’ihi na ifufe nēfegide ya.

25 Ma na nche nke-anọ n’abali Ọ biakutere ha, nēje ije n’elu oké osimiri.

26 Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru Ya ka Ọ nēje ije n’elu oké osimiri, obi we lọ ha miri, ha si, Ọ bu mọ; ha we tie nkpu site n’egwù.

27 Ma ngwa ngwa Jisus gwara ha okwu, si, Nwenu obi-ike; ọ bu Mu: unu atula egwu.

28 Pita we za Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ bu Gi onwe-gi, sim biakute Gi n’elu miri.

29 Ọ si, Bia. Pita we si n’ub͕ọ rida, je ije n’elu miri ahu, ijekuru Jisus.

30 Ma mb͕e ọ huru ifufe, ọ tua egwu; ebe ọ malitere imìkpu, o ti kwa nkpu, si, Onye-nwe-ayi, zọputam.

31 Ngwa ngwa Jisus setiri aka-Ya, jide ya, si ya, Onye okwukwe ntà, n’ìhi gini ka i ji nwe obi abua?

32 Mb͕e ha rigoro n’ub͕ọ, ifufe we febìe.

33 Ma ndi nọ n’ub͕ọ ahu kpọrọ isi ala nye Ya, si, I bu Ọkpara Chineke n’ezie.

34 Mb͕e ha gabigasiri, ha bia rue ala, rue Genesaret.

35 Mb͕e ndikom ebe ahu mazuru Ya, ha we ziga n’ala ahu dum di buruburu, kutara Ya madu nile aru nādighi nma;

36 ha nāriọ kwa Ya ka ha metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka, nání ya: ewe zọputa ha, ka ha ra, bú ndi meturu Ya aka.

Categories
MATIU

MATIU 15

1 Mb͕e ahu ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ siri na Jerusalem biakute Jisus, si,

2 N’ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējehie n’ozizí ndi-okenye nyere ayi n’aka idebe? n’ihi na ha adighi-akwọ aka mb͕e ọ bula ha nēri nri.

3 Ma Ọ zara, si ha, N’ìhi gini ka unu onwe-unu nējehie kwa n’ihe Chineke nyere n’iwu n’ihi ozizí enyere unu n’aka?

4 N’ihi na Chineke siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Onye kwujọrọ nna maọbu nne, ya nwua ọnwu ahu.

5 Ma unu onwe-unu nāsi, Onye ọ bula nke gāsi nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n’akam bu ihe enyere Chineke;

6 ọ gaghi-asọpuru nna-ya ma-ọbu nne-ya ma-ọli. Unu nēme kwa okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu n’ihi ozizí enyere unu n’aka idebe.

7 Ndi-iru-abua, Aisaia buru amuma nke-ọma bayere unu, si,

8 Ndi nka nāsọpurum n’eb͕ub͕ere-ọnu-ha;

Ma obi-ha di anya n’ebe M’nọ.

9 Ma ha nēbirim isi ala n’efu,

Nēzì ihe madu nyere n’iwu ka ha buru ozizí-ha.

10 O we kpọ ìgwè madu ahu biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu, ghọta-kwa-nu:

11 Ọ bughi ihe nābà n’ọnu nēmeru madu; kama ihe si n’ọnu puta, ọ bu nke ahu nēmeru madu.

12 Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si Ya, Ì matawo na emere ka ndi-Farisi ma n’ọnyà, mb͕e ha nuru okwu ahu?

13 Ma Ọ zara, si, Agēropu ihe-ọkukú ọ bula nke Nnam nke elu-igwe nākughi.

14 Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n’olùlù.

15 Pita we za, si Ya, Kọrọ ayi isi ilu a.

16 O we si, Ùnu onwe-unu di kwa nēnweghi nghọta we rue ub͕u a?

17 Ùnu atugharighi uche-unu na ihe ọ bula nke nābà n’ọnu nāga n’afọ, ewe nyupu ya n’ulo-ǹsí?

18 Ma ihe nke si n’ọnu puta nēsi nime obi aputa; ihe ndia nēmeru kwa madu.

19 N’ihi na n’obi ka ajọ èchìchè nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko nile, ori nile, àmà ugha nile, nkwulú nile, si aputa:

20 ndia bu ihe nēmeru madu: ma iwere aka anākwọghi akwọ iri ihe adighi-emeru madu.

21 Jisus we si n’ebe ahu pua, wezuga Onwe-ya ga n’akuku Taia na Saidon.

22 Ma le, otù nwanyi Kenean siri n’ókè-ala ahu puta, tie nkpu, si, Merem ebere, Onye-nwe-ayi, Nwa Devid; mọ ọjọ nējisi nwam nwanyi ike.

23 Ma Ọ zaghi ya okwu ọ bula. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, nēkpere Ya, si, Zilaga ya; n’ihi na ọ nētiso ayi nkpu.

24 Ma Ọ zara, si, Eziteghm ma-ọbughi ijekuru aturu furu efu nke ulo Israel.

25 Ma nwanyi ahu biara nākpọ isi ala nye Ya, si, Onye-nwe-ayi, yerem aka.

26 Ma Ọ zara, si, Ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita.

27 Ma ọ siri, E, Onye-nwe-ayi: n’ihi na ọbuná umu-nkita nēri ufọdu nime irighiri nke nādaputa na table nke ndi-nwe-ha.

28 Mb͕e ahu Jisus zara, si ya, Nwayi, okwukwe-gi di uku: ka emere gi dika i nāchọ. Ewe me ka aru di nwa-ya nwanyi ike site n’oge hour ahu.

29 Jisus we si n’ebe ahu pua bia n’usọ osimiri Galili; O we rigo n’ugwu ahu, we nọdu n’ebe ahu.

30 Ọtutu ìgwè madu we biakute Ya, chiri ndi-ngwurọ, ndi-ìsì, ndi-ob͕i, ndi-ọlusi, na ọtutu ndi-ọria di iche, tiyere onwe-ha, ha we tọb͕ọ ha n’ala n’ukwu-Ya; O we me ka aru-ha di ike:

31 ya mere na o juru ìgwè madu ahu anya, mb͕e ha huru ndi-ob͕i ka ha nēkwu okwu, na ndi-ọlusi ka aru-ha di nma, na ndi-ngwurọ ka ha nēje ije, na ndi-ìsì ka ha nāhu uzọ: ha we to Chineke nke Israel.

32 Jisus we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si, Enwerem ọmiko n’aru ìgwè madu a, n’ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri: ma achọghm izilaga ha n’ọnu efu, ka ha ghara ida #mbà n’uzọ ma eleghi anya.

33 Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe ka ayi gēsi nwe ọtutu ob͕e achicha ra otú a n’ọhia, inyeju oké ìgwè madu di otú a afọ?

34 Jisus we si ha, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa, na azù ntà ole-na-ole.

35 O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala;

36 O we nara ob͕e achicha asa ahu na azù ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile.

37 Ha nile we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, abọ asa juru.

38 Ma ndi riri bu nnù ndikom iri, nāgughi ndinyom na umuaka.

39 Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ ba n’ub͕ọ ahu, bia n’ókè-ala Magadan.

Categories
MATIU

MATIU 16

1 Ndi-Farisi na ndi-Sadusi we biakute Ya, jua Ya ka O gosi ha ihe-iriba-ama site n’elu-igwe, nānwa Ya.

2 Ma Ọ zara, si ha, Mb͕e o ruru anyasi, unu nāsi, Iru elu-igwe gādi nma: n’ihi na elu-igwe nācha uhie uhie.

3 N’ututu unu nāsi kwa, Iru elu-igwe gājọ njọ ta: n’ihi na elu-igwe nācha uhie uhie, b͕aru kwa. Unu mara itule iru elu-igwe, ma unu apughi itule ihe-iriba-ama nke oge ndia.

4 Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; ma agaghi-enye ya ihe-iriba-ama, ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona. O we rapu ha, pua.

5 Ndi nēso uzọ-Ya we bia n’ofè ọzọ, chezọ kwa iji ob͕e achicha.

6 Jisus we si ha, Nēlenu anya, nēze kwa ihe ndi-Farisi na ndi-Sadusi, bú ihe nēko achicha.

7 Ha we nēkwurita n’etiti onwe-ha, si, Ayi ejighi ob͕e achicha.

8 Ma ebe Jisus mara ya Ọ si, Ndi okwukwe ntà, gini mere unu nēkwurita n’etiti onwe-unu, n’ihi na unu enweghi ob͕e achicha?

9 Ùnu akātugharighi uche, ùnu echetaghi kwa ob͕e achicha ise nke nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri ahu, na nkata ole unu nara?

10 Ùnu echetaghi kwa ob͕e achicha asa nke nnù ndikom iri ahu, na abọ ole unu nara?

11 Ùnu si aṅa ghara itughari uche na agwaghm unu okwu bayere ob͕e achicha? Ma nēzenu ihe ndi-Farisi na ndi-Sadusi, bú ihe nēko achicha.

12 Mb͕e ahu ka ha ghọtara na Ọ sighi ha nēze ihe nēko ob͕e achicha, kama ka ha nēze ozizí ndi-Farisi na ndi-Sadusi.

13 Ma mb͕e Jisus biara n’akuku Sisaria Filipi, Ọ jua ndi nēso uzọ-Ya, si, Ònye ka madu nāsi na Nwa nke madu bu?

14 Ha we si, Ufọdu si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ibe-ha si, Jeremaia, ma-ọbu otù nime ndi-amuma.

15 Ọ si ha, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu?

16 Saimon Pita we za, si, Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke di ndu.

17 Jisus we za, si ya, Ngọzi nādiri gi, Saimon Bā-Jona: n’ihi na anu-aru na ọbara ekpugheghi ya nye gi, kama ọ bu Nnam Nke bi n’elu-igwe.

18 Ma Mu onwem si kwa gi, na gi onwe-gi bu Pita, ọ bu kwa n’elu oké nkume a ka M’gēwu nzukọm dika ulo; ọnu-uzọ nilenke Hedis agaghi-aka kwa ya n’ike.

19 M’gēnye gi nkpisi-ugodi nke ala-eze elu-igwe: ihe ọ bula i gēke kwa ab͕u n’elu uwa, agēke ya n’elu-igwe: ihe ọ bula i gātọpu kwa ab͕u n’elu uwa, agātọpu ya n’elu-igwe.

20 Mb͕e ahu Ọ dọrọ ndi nēso uzọ-Ya aka na nti ka ha ghara igwa onye ọ bula na Ya onwe-ya bu Kraist ahu.

21 Site na mb͕e ahu Jisus Kraist malitere igosi ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ ghaghi ije Jerusalem, na ihu ọtutu ahuhu n’aka ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, na aghaghi ib͕u Ya, me kwa ka O si n’ọnwu bilie n’ubochi nke-atọ.

22 Pita we kuru Ya nye n’aru, malite ibara Ya nba, si, Chineke mere Gi ebere, Onye-nwe-ayi: ihe a agaghi-adiri Gi ma-ọli.

23 Ma O chighariri, si Pita, Ga n’azum, Setan: i bu ihe nēme ka M’ma n’ọnyà: n’ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n’ihe Chineke, kama ọ bu n’ihe madu.

24 Mb͕e ahu Jisus siri ndi nēso uzọ-Ya, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n’azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam.

25 N’ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n’ihim, ọ gāhu ya.

26 N’ihi na ùrù gini ka ọ gābara madu, ma ọ buru na o gērita uwa dum n’urù, ewe napu ya ndu-ya? ma-ọbu ìhe-nb͕anwe gini ka madu gēji b͕anwe ndu-ya?

27 N’ihi na Nwa nke madu gaje ibia n’ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi-Ya; mb͕e ahu ka Ọ gēnyeghachi kwa onye ọ bula dika omume-ya si di.

28 N’ezie asim unu, Ufọdu di n’etiti ndi guzoro n’ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ha gāhu Nwa nke madu ka Ọ nābia n’ala-eze-Ya.

Categories
MATIU

MATIU 17

1 Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne-ya, tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n’ugwu di elu we pua iche:

2 O we nwogha n’iru ha: iru-Ya we nēnwupu dika anyanwu, uwe-Ya nile we nācha ucha dika ìhè.

3 Ma le, eme ka ha hu Moses na Elaija ka ha na Ya nēkwurita okwu.

4 Pita we za, si Jisus, Onye-nwe-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n’ebe a: ọ buru na I nāchọ, m’gāma ulo-ikwū atọ n’ebe a; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija.

5 Mb͕e ọ kpu okwu n’ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n’igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya.

6 Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ha we da kpuchie iru-ha n’ala, tu kwa egwu ri nne.

7 Jisus we biakute ha, metu ha aka, si, Bilienu, unu atu-kwa-la egwu.

8 Ma mb͕e ha weliri anya-ha elu, ha ahughi onye ọ bula, ma-ọbughi nání Jisus.

9 Mb͕e ha si n’ugwu ahu nārida, Jisus we nye ha iwu, si, Unu agwala onye ọ bula ihe unu huru, rue mb͕e Nwa nke madu gēsi na ndi nwuru anwu bilie.

10 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Gini mere ndi-ode-akwukwọ ji si kwa na Elaija aghaghi ibu uzọ bia?

11 O we za, si, Ọ bu ezie na Elaija nābia, Ọ gēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu:

12 ma asim unu, na Elaija abiawori ub͕u a, ha amazughi kwa ya, kama ha mere n’aru-ya ka ihe ha chọrọ ra. Ọbuná otú a ka ha gaje ime kwa ka Nwa nke madu hu ahuhu.

13 Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya ghọtara na Ọ gwara ha okwu bayere Jọn Baptist.

14 Mb͕e ha biakutere ìgwè madu ahu, otù nwoke we biakute Ya, nēb͕uru Ya ikperè, nāsi kwa,

15 Onye-nwe-ayi, mere nwam nwoke ebere: n’ihi na ọ bu onye ọnwa nēme ka anya ghara idi ya nma, ọ nāhu kwa ahuhu nke-uku: n’ihi na ọtutu mb͕e ọ nādabà n’ọku, ọtutu mb͕e ọ nādabà kwa na miri.

16 M’we kuru ya biakute ndi nēso uzọ-Gi, ma ha apughi ime ka aru-ya di ike.

17 Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ? rùe ole mb͕e ka M’gānagide unu? unu kutaram ya n’ebe a.

18 Jisus we bara ya nba; mọ ọjọ ahu we si nime ya puta: ewe me ka aru nwa-okoro ahu di ike site n’oge hour ahu.

19 Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus iche, si, N’ìhi gini ka ayi onwe-ayi nāpughi ichupu ya?

20 O we si ha, N’ihi okwukwe ntà unu: n’ihi na n’ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi ugwu a, Si n’ebe a gabiga n’ebe ahu; ọ gāgabiga kwa; ihe ọ bula agaghi-adi kwa nke unu nāpughi ime.

21 Ma otú ọ di mọ di otú a apughi iputa ma-ọbughi site n’ekpere na ibu-ọnu.

22 Ma mb͕e ha bi na Galili, Jisus siri ha, Agaje irara Nwa nke madu nye n’aka madu;

23 ha gēb͕u kwa Ya, ewe me ka O si n’ọnwu bilie n’ubọchi nke-atọ. O we wuta ha ri nne.

24 Ma mb͕e ha biara na Kapanaum, ndi nānara ego ùtú biakutere Pita, si, Ònye-ozizí-unu adighi-atu ego ùtú?

25 Ọ si, E. Mb͕e ọ batara n’ulo, Jisus we buru uzọ gwa ya okwu, si, Gini bu uche-gi, Saimon? ndi-eze uwa, sìte n’aka ole ndi ka ha nānara ùtú-ahia ma-ọbu ùtú n’isi madu? n’àka umu-ha, ma-ọbu n’aka ndi-ọbìa?

26 Ma mb͕e ọ siri, N’aka ndi-ọbìa, Jisus si ya, Ya mere umu-ha puru nime ya.

27 Ma, ka ayi we ghara ime ka ha ma n’ọnyà, ga rue oké osimiri, tubà nko-azù, were azù nke buru uzọ puta; mb͕e i saghesiri ọnu-ya, i gāhu kwa otù shekel: were nke ahu, nye ha ka ọ buru nke Mu na gi.

Categories
MATIU

MATIU 18

1 N’oge hour ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus, si, Ònye kwa dikariri uku n’ala-eze elu-igwe?

2 O we kpọ otù nwatakiri biakute Ya, Ọ debe ya n’etiti ha,

3 si, N’ezie asim unu, Ọ buru na unu echigharighi, bia di ka umu-ntakiri, unu agaghi-abà n’ala-eze elu-igwe ma-ọli.

4 Ya mere, onye ọ bula nke gēweda onwe-ya dika nwatakiri a, onye ahu dikariri uku n’ala-eze elu-igwe.

5 Ọzọ, onye ọ bula nke gānara otù nwatakiri di otú a nke-ọma n’aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma:

6 ma onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwere na Mu ka ọ ma n’ọnyà, ihe gābara ya urù bu ka ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n’olu, ka o mìkpu kwa n’ob͕u oké osimiri.

7 Ahuhu gādiri uwa site n’ihe di iche iche nēme ka madu ma n’ọnyà; n’ihi na ọ di nkpà na ihe ahu nēme ka madu ma n’ọnyà gābia; ma ahuhu gādiri madu ahu onye ihe ahu nēme ka madu ma n’ọnyà nēsite n’aka-ya bia.

8 Ma ọ buru na aka-gi ma-ọbu ukwu-gi eme gi ka i ma n’ọnyà, bipu ya, tupu kwa ya n’aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu n’ọlusi ma-ọbu na ngwurọ, kari inwe aka abua ma-ọbu ukwu abua atubà i n’ọku ebighi-ebi.

9 Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n’ọnyà, wepu ya, tupu kwa ya n’aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n’ọku ala-mọ.

10 Lezienu anya ka unu ghara ilelì otù nime ndi ntà ndia anya; n’ihi na asim unu, na mb͕e nile ndi-mọ-ozi-ha n’elu-igwe nēlegide iru Nnam Nke bi n’elu-igwe.

11 N’ihi na Nwa nke madu biara izọputa ndi nile furu efu.

12 Gini bu uche-unu? ọ buru na onye ọ bula nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha hie uzọ, ọ̀ dighi-agha ọgu anọ na iri na iteghete ahu, ga ugwu, nāchọ nke ahu hiere uzọ?

13 Ma ọ buru na o nwere ka o si chọta ya, n’ezie asim unu, ọ nāṅuri n’isi ya kari n’isi ọgu anọ na iri na iteghete ahu nēhieghi uzọ.

14 Otú a ọ bughi ihe achọrọ n’iru Nna-unu Nke bi n’elu-igwe, ka otù nime ndi ntà ndia la n’iyì.

15 Ọzọ, ọ buru na nwa-nna-gi emehie megide gi, je, tua ya nmehie-ya n’anya n’etiti nání gi na ya abua: ọ buru na ọ nuru olu-gi, i ritara nwa-nna-gi n’urù.

16 Ma ọ buru na ọ nughi, kuru otù madu ma-ọbu madu abua ọzọ tiyere onwe-gi, ka ewe me okwu ọ bula ekwuru ka o guzo n’ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ.

17 Ma ọ buru na ọ ṅaghi ha nti, gwa nzukọm: ma ọ buru na ọ ṅaghi kwa nzukọm nti, ka ọ diri gi ka onye mba ozọ na onye-ọna-utu.

18 N’ezie asim unu, Ka ha ra, bú ihe unu gēke ab͕u n’elu uwa, agēke ha n’elu-igwe: ka ha ra kwa, bú ihe unu gātọpu n’elu uwa, agātọpu ha n’elu-igwe.

19 Ọzọ, asim unu, na ọ buru na madu abua n’etiti unu gēnwe otù olu n’elu uwa bayere ihe ọ bula ha gāriọ, agēme ya nye ha site na Nnam Nke bi n’elu-igwe.

20 N’ihi na ebe madu abua ma-ọbu atọ zukọworo n’aham, n’ebe ahu ka M’nọ n’etiti ha.

21 Mb͕e ahu Pita biakutere Ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, ùb͕ò ole ka nwa-nnam gēmehie megidem, ewem b͕aghara ya? rùe ub͕ò asa?

22 Jisus si ya, Asighm i, Rue ub͕ò asa; kama, Rue ọgu ub͕ò atọ na iri uzọ asa.

23 N’ihi nka ewere ala-eze elu-igwe tuyere otù eze, onye chọrọ ka ya na ndi-orù-ya piazie.

24 Ma mb͕e ọ malitere ipiazi, ewe kutara ya otù onye, nke ji ya orú nnù talent na nnù ise.

25 Ma ebe o nweghi ihe o gēji kwughachi, onye-nwe-ya siri ka ere ya, na nwunye-ya, na umu-ya, na ihe nile o nwere, ka ha ra, ka akwughachi kwa ugwọ.

26 Ya mere orù ahu dara n’ala nākpọ isi ala nye ya, si, Onye-nwe-ayi, nwe ogologo-ntachi-obi n’arum, na m’gākwughachi gi ihe nile.

27 Ma ebe onye-nwe orù ahu nwere ọmiko n’aru ya, ọ rapu ya, b͕aghara kwa ya ihe ahu o binyere ya-ri.

28 Ma orù ahu puru, hu otù nime ndi-orù-ibe-ya, nke ji ya ọgu shilling ise: o we jidesie ya aka ike, ri ya aka n’akpiri, si, Kwughachim ihe i ji.

29 Ya mere orù-ibe-ya dara n’ala, riọ ya, si, Nwe ogologo-ntachi-obi n’arum, na m’gākwughachi gi.

30 Ma ọ chọgh: kama o jere tubà ya n’ulo-nkpọrọ, rue mb͕e ọ gākwughachi ihe o ji.

31 Ya mere mb͕e ndi-orù-ibe-ya huru ihe emere, o wuta ha ri nne n’obi, ha we bia kọrọ onye-nwe-ha ihe nile mere.

32 Mb͕e ahu onye-nwe-ya kpọrọ ya biakute ya, si ya, Ajọ orù, ab͕agharam i ugwọ ahu nile, n’ihi na i riọrọm:

33 ọ̀ kwesighi kwa gi imere orù-ibe-gi ebere ọbuná dika mu onwem mere gi ebere?

34 Onye-nwe-ya were iwe, we rara ya nye n’aka ndi-nmekpa-aru, rue mb͕e ọ gākwughachi ugwọ nile o ji.

35 Otú a ka Nnam nke elu-igwe gēme kwa unu, ọ buru na unu ab͕agharaghi, onye ọ bula nmehie nwa-nne-ya, site n’obi-unu.

Categories
MATIU

MATIU 19

1 O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia, O si na Galili zọlie, bia n’ókè-ala Judia n’ofè Jọdan;

2 oké ìgwè madu we so Ya; O we me ka aru-ha di ike n’ebe ahu.

3 Ndi-Farisi we biakute Ya, nānwa Ya, si, Ò ziri ezi n’iwu ka nwoke rapu nwunye-ya n’ihi ihe nile ọ bula?

4 O we za, si, Ùnu agughi na Onye kère ha site na nmalite mere ha nwoke na nwayi,

5 we si, N’ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n’aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru?

6 Ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala.

7 Ha si Ya, Gini kwa ka Moses ji nye iwu inye akwukwọ nkewa, na irapu ya?

8 Ọ si ha, Ọ bu n’ihi obi-etili-unu ka Moses kwere ka unu rapu nwunye-unu: ma site na nmalite adighi-eme otú a.

9 Ma asim unu, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n’ihi ikwa-iko, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko: onye nke gālu nwanyi ahu mb͕e arapuworo ya nākwa kwa iko.

10 Ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Ọ buru na okwu di otú a n’etiti nwoke na nwunye-ya, ọ baghi urù ilu nwunye.

11 Ma Ọ siri ha, Ọ bughi madu nile nānagide okwu a, kama ọ bu ndi enyeworo ya.

12 N’ihi na ndi-onozi di, ndi amuru otú a site n’afọ nne-ha: ndi-onozi di kwa, ndi emere onozi site n’aka madu: ndi-onozi di kwa, ndi mere onwe-ha onozi n’ihi ala-eze elu-igwe. Onye puru inagide ya, ya nagide.

13 Mb͕e ahu ekutara Ya umu-ntakiri, ka O we bikwasi ha aka-Ya abua, kpe kwa ekpere: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba.

14 Ma Jisus siri, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n’ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi di otú a.

15 O we bikwasi ha aka-Ya abua, si n’ebe ahu pua.

16 Ma le, otù onye biakutere Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu ezi ihe gini ka m’gēme, ka m’we nwe ndu ebighi-ebi?

17 Ma Ọ siri ya, Gini mere i nājum ajuju bayere nke bu ezi ihe? Otù Onye di Nke bu ezi Onye: ma ọ buru na i nāchọ ibà nime ndu ahu, debe ihe nile enyere n’iwu.

18 Ọ si Ya, Òle? Jisus we si, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha,

19 Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi.

20 Nwa-okorọbia ahu si Ya, Ihe ndia nile ka m’ribara ama: gini fọdurum ọzọ ime?

21 Jisus siri ya, Ọ buru na i nāchọ ka i zue okè, laba, re ihe nile i nwere, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n’elu-igwe: bia kwa, som.

22 Ma mb͕e nwa-okorọbia ahu nuru okwu a, ọ lara na nwuta: n’ihi na ọ bu onye nwere ihe ri nne.

23 Jisus we si ndi nēso uzọ-Ya, N’ezie asim unu, Ọ diri ọgaranya ike ibà n’ala-eze elu-igwe.

24 Ọzọ kwa, asim unu, Ọ dikarari camel nfé igabiga n’anya àgìgá, kari ọgaranya ibà n’ala-eze Chineke.

25 Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ibobo nwuru ha n’aru ri nne, ha si, Ònye kwa ka apuru izọputa?

26 Ma Jisus lere ha anya, si ha, N’ebe madu nọ nka bu ihe anāpughi ime; ma apuru ime ihe nile n’ebe Chineke nọ.

27 Mb͕e ahu Pita zara, si Ya, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile, we so Gi; gini kwa ka ayi gēnwe?

28 Jisus we si ha, N’ezie asim unu, na unu onwe-unu ndi sorom, n’imu-ọzọ ahu, mb͕e ọ bula Nwa nke madu gānọkwasi n’oche-eze nke ebube-Ya, unu onwe-unu gānọkwasi kwa n’oche-eze iri na abua, nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé.

29 Ọzọ, onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne ndikom, ma-ọbu umu-nne ndinyom, ma-ọbu nna, ma-ọbu nne, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n’ihi aham, ọ gānata ọgu ise ọgu ise, keta kwa ndu ebighi-ebi.

30 Ma ọtutu ndi bu uzọ gābu ndi-ikpe-azu; ndi ikpe-azu gābu kwa ndi bu uzọ.

Categories
MATIU

MATIU 20

1 N’ihi na ala-eze elu-igwe yiri nwoke nke bu nna-nwe-ulo, onye puru n’isi-ututu igota ndi-ọlu ije n’ubi-vine-ya.

2 Ma mb͕e ya na ndi-ọlu ahu nwere otù olu ka o nye ha otù shilling kwa-ubọchi, o zigara ha n’ubi-vine ya.

3 Ọ we pua dika oge hour nke-atọ, hu ndi ọzọ ka ha nēguzo n’ọma-ahia nālughi ọlu;

4 o we si ndi ahu, Unu onwe-unu ga kwa n’ubi-vine nkem, ihe ọ bula ziri ezi ka m’gēnye unu. Ha we je.

5 Ọ we pu kwa ọzọ dika oge hour nke-isi na nke-iteghete, me kwa otú ahu.

6 Ọ we pua dika oge hour nke-iri-na-otù, hu ndi ọzọ ka ha nēguzo; ọ si ha, Gini mere unu guzoro n’ebe a ubọchi dum nālughi ọlu?

7 Ha si ya, N’ihi na ọ dighi onye ọ bula goro ayi ilu ọlu. Ọ si ha, Unu onwe-unu ga kwa n’ubi-vine nkem.

8 Ma mb͕e o ruru anyasi, onye-nwe ubi-vine ahu si onye o tiyere ihe-ya n’aka, Kpọ ndi-ọlu ahu, kwua ha ugwọ-ọlu-ha, malite site na ndi-ikpe-azu rue ndi bu uzọ.

9 Mb͕e ndi egoro n’oge hour nke-iri-na-otù biara, ha we nata otù onye otù shilling.

10 Ma mb͕e ndi bu uzọ biara, ha chère na ha gānata nke ka; ma ha onwe-ha nata-kwa-ra otù onye otù shilling.

11 Ma mb͕e ha natara ya, ha tamube megide nna-nwe-ulo ahu,

12 si, Ndi-ikpe-azu a luru otù hour, i we me ka ayi na ha ra, ayi ndi būru ibu arọ́ nke ubọchi ta, ya na ifufe di ọku.

13 Ma ọ zara otù onye nime ha, si, Eyìm, emejọghm i: mù na gi enweghi otù olu ka m’nye gi otù shilling?

14 Welie nke bu nke gi, la; anamachọ ka m’nye onye-ikpe-azu a dika m’nye-kwa-ra gi.

15 Ò zighi ezi n’iwu ka m’were ihe nile nkem me ihe m’nāchọ? ma-ọbu ànya-gi jọrọ njọ, n’ihi na mu onwem bu ezi madu?

16 Otú a ndi-ikpe-azu gēbu uzọ, ndi bu uzọ gābu kwa ndi-ikpe-azu.

17 Mb͕e Jisus nārigoro Jerusalem, O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu iche, bú ndi nēso uzọ-Ya, tiyere Onwe-ya, O we si ha n’uzọ,

18 Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n’aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpé ọnwu,

19 rara Ya nye n’aka ndi mba ọzọ ka ha me Ya ihe-ọchì, pia Ya ihe, kpọgide Ya n’obe: agēme kwa ka O si n’ọnwu bilie n’ubọchi nke-atọ.

20 Mb͕e ahu nne umu Zebedi biakutere Ya, ya na umu-ya ndikom, nākpọ isi ala nye Ya, nāriọ kwa Ya ihe n’aka.

21 O we si ya, Gini ka i nāchọ? Ọ si Ya, Kwue ka umum ndikom abua ndia nọdu, otù n’aka-nri-Gi, otù n’aka-ekpe-Gi, n’ala-eze-Gi.

22 Ma Jisus zara, si, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem gaje iṅu? Ha si Ya, Ayi puru.

23 Ọ si ha, Ikom ka unu gāṅu n’ezie: ma inọdu n’aka-nrim, na n’aka-ekpem, abughi nkem inye, kama ọ diri ndi Nnam doziworo ya.

24 Ma mb͕e ndi-ozi iri fọduru nuru ya, iwe were ha nke-uku n’ihi umu-nne abua ahu.

25 Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Unu amatawo na ndi bu isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha: ndi uku ha nāchi kwa ha.

26 Ọ bughi otú a ka ọ gādi n’etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n’etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi;

27 ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n’etiti unu, ọ gābu orù-unu:

28 dika Nwa nke madu abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n’ọnọdu ọtutu madu.

29 Mb͕e ha nāputa na Jeriko, oké ìgwè madu we so Ya.

30 Ma le, ndi-ìsì abua ndi nānọdu n’akuku uzọ, mb͕e ha nuru na Jisus nāgabiga, ha tie nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.

31 Ìgwè madu ahu we bara ha nba, ka ha kpuchie ọnu-ha: ma ha tikariri nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.

32 Jisus we guzo, kpọ ha, we si, Gini ka unu nāchọ ka M’mere unu?

33 Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, ka ewe meghe anya-ayi.

34 Ma Jisus, ebe O nwere ọmiko n’aru-ha, O we metu anya-ha aka: ngwa ngwa ewe me ka ha hu uzọ, ha we so Ya.