Categories
MATIU

MATIU 1

1 Akwukwọ osuso-ọmumu Jisus Kraist, Nwa Devid, nwa Abraham.

2 Abraham muru Aisak; Aisak we mua Jekob; Jekob we mua Juda na umu-nna-ya;

3 Juda we mua Perez na Zera site na Tema; Perez we mua Hezron; Hezron we mua Ram;

4 Ram we mua Aminadab; Aminadab we mua Nahshon; Nahshon we mua Salmon;

5 Salmon we mua Boaz site na Rehab; Boaz we mua Obed site na Rut; Obed we mua Jesi;

6 Jesi we mua Devid, bú eze.

Devid we mua Solomon site na nwunye nke Uraia;

7 Solomon we mua Rehoboam; Rehoboam we mua Abaija; Abaija we mua Esa;

8 Esa we mua Jehoshafat; Jehoshafat we mua Joram; Joram we mua Uzaia;

9 Uzaia we mua Jotam; Jotam we mua Ehaz; Ehaz we mua Hezekaia;

10 Hezekaia we mua Manase; Manase we mua Emon; Emon we mua Josaia;

11 Josaia we mua Jekonaia na umu-nne-ya, na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon.

12 Mb͕e emesiri ka ha je biri na Babilon, Jekonaia we mua Shealtiel; Shealtiel we mua Zerubabel;

13 Zerubabel we mua Abaiud; Abaiud we mua Elaiakim; Elaiakim we mua Ezoa;

14 Ezoa we mua Sedok; Sedok we mua Akim; Akim we mua Elaiud;

15 Elaiud we mua Eleeza; Eleeza we mua Matan; Matan we mua Jekob;

16 Jekob we mua Josef di Meri, nwanyi nke muru Jisus, Onye anākpọ Kraist.

17 Ya mere ọb͕ọ nile site n’Abraham rue Devid di ọb͕ọ iri na anọ; site na Devid rue mb͕e emere ka ha je biri na Babilon di kwa ọb͕ọ iri na anọ; site na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon rue Kraist di kwa ọb͕ọ iri na anọ.

18 Ma ọmumu Jisus Kraist di otú a: Mb͕e ekwereri na Josef gālu nne-Ya Meri, mb͕e ha akēdinakọtaghi, ahuru na ọ di ime site na Mọ Nsọ.

19 Ma Josef di-ya, ebe ọ bu onye ezi omume, ma ọ chọghi igosi ya n’iru ọra, o zubere irapu ya na nzuzo.

20 Ma mb͕e ihe ndia di ya n’obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n’ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n’aka Mọ Nsọ.

21 Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n’ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha.

22 Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n’ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si,

23 Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke,

Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel;

nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.

24 Josef we si n’ura-ya bilie, me dika mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nyere ya iwu, we kuru nwunye-ya;

25 ọ maghi kwa ya rue mb͕e ọ muputara Nwa-nwoke: o we kpọ aha-Ya Jisus.

Categories
MATIU

MATIU 2

1 Ma mb͕e amuru Jisus na Betlehem nke Judia n’ubọchi Herod, bú eze, le, ufọdu ndi mara ihe, ndi sitere n’Ọwuwa-anyanwu, biaruru Jerusalem,

2 si, Òle ebe Ọ nọ, bú Onye amuru ibu Eze ndi-Ju? n’ihi na ayi huru kpakpando-Ya n’Ọwuwa-anyanwu, ayi we bia ikpọ isi ala nye Ya.

3 Ma mb͕e Herod, bú eze, nuru, obi lọrọ ya miri, ya na Jerusalem nile.

4 O we me ka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ nile nke ndi-Ju zukọ, o we jua n’ọnu-ha ebe agāmu Kraist nke ha.

5 Ha we si ya, Na Betlehem nke Judia: n’ihi na otú a ka edeworo ya n’akwukwọ site n’aka onye-amuma, si,

6 Gi Betlehem kwa, ala Juda,

I dighi nke-ntà kachasia n’etiti ndi-isi Juda ma-ọli:

N’ihi na n’etiti gi ka Onye-isi gāputa,

Onye gāzù ndi nkem Israel dika aturu.

7 Mb͕e ahu Herod kpọrọ ha na nzuzo, bú ndi ahu mara ihe, o we juta nke-ọma n’ọnu-ha oge kpakpando ahu nke nāputa ìhè.

8 O we zìe ha je Betlehem, si, Ganu chọputa nke-ọma okwu bayere Nwatakiri ahu; ma mb͕e ọ bula unu gāchọta Ya, bia kọrọm, ka mu onwem we je kwa kpọ isi ala nye Ya.

9 Mb͕e ha nuru okwu eze ahu, ha we ga; ma le, kpakpando ahu, nke ha huru n’Ọwuwa-anyanwu, ọ nāga n’iru ha, rue mb͕e ọ biara guzo n’elu ebe Nwatakiri ahu nọ.

10 Mb͕e ha huru kpakpando ahu ha we ṅuria oké ọṅù nke-uku.

11 Ha we ba nime ulo, hu Nwatakiri ahu, Ya na Meri nne-Ya; ha we da n’ala kpọ isi ala nye Ya; ha we kpughe ib͕e àkù ha, che onyinye n’iru Ya, ọla-edo na frankincense na myrrh.

12 Ebe Chineke duru ha ọdú na nrọ ka ha ghara ilaghachi jekuru Herod, ha we wezuga onwe-ha ga ala-ha site n’uzọ ọzọ.

13 Ma mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ, si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya b͕alaga n’Ijipt, nọ n’ebe ahu rue mb͕e ọ bula m’gāgwa gi: n’ihi na Herod gaje ichọ Nwatakiri ahu ka ọ la Ya n’iyì.

14 O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya n’abali, wezuga onwe-ya ga Ijipt;

15 O we nọ n’ebe ahu rue ọnwu Herod: ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n’ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si, Site n’Ijipt ka M’kpọputara Nwam.

16 Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n’obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n’ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n’ọnu ndi ahu mara ihe.

17 Mb͕e ahu ka emezuru okwu ekwuru site n’ọnu Jeremaia onye-amuma, si,

18 Anuru olu na Rema,

Ikwa-ákwá na iru-újú uku,

Rechel nākwara umu-ya ákwá;

Ọ chọghi kwa ka akasie ya obi, n’ihi na ha adighi.

19 Ma mb͕e Herod nwusiri, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ n’Ijipt,

20 si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya, ga ala Israel: n’ihi na ndi nāchọ ndu Nwatakiri ahu anwuwo.

21 O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya, je ala Israel.

22 Ma mb͕e ọ nuru na Akeleọs bu eze Judia n’ọnọdu nna-ya Herod, ọ turu egwu ije ebe ahu; ma ebe Chineke duru ya ọdú na nrọ, o wezugara onwe-ya ga n’akuku Galili,

23 we bia biri n’obodo anākpọ Nazaret: ka okwu ekwuru site n’ọnu ndi-amuma we mezu, na agākpọ Ya Onye Nazaret.

Categories
MATIU

MATIU 3

1 Ma na mb͕e ahu Jọn Baptist biara, nēkwusa n’ọhia nke Judia,

2 si, Chègharianu; n’ihi na ala-eze elu-igwe di nso.

3 N’ihi na nwoke a bu onye ekwuru okwu bayere ya site n’ọnu Aisaia onye-amuma, si,

Olu otù onye nēti nkpu n’ọhia, si,

Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi,

Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.

4 Ma Jọn onwe-ya nwere uwe-oyiyi-ya nke aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n’úkwù-ya; nri-ya bu kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia.

5 Mb͕e ahu Jerusalem, na Judia nile, na ala nile di Jọdan buruburu, nāpukuru ya;

6 ọ nēme kwa ha baptism n’osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha.

7 Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?

8 Ya mere, mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu;

9 unu echè-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n’ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.

10 Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile: ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.

11 Mu onwem nēji miri me unu baptism n’ezie ka unu we chègharia: ma Onye nke nābia n’azum kam ike, Onye m’nērughi ichi akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:

12 Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n’aka-Ya, Ọ gāfuchapu kwa ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, Ọ gēkpokọta kwa ọka-Ya n’ọba-Ya, ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.

13 Mb͕e ahu Jisus siri na Galili bia rue Jọdan jekuru Jọn ahu, ka o we me Ya baptism.

14 Ma Jọn nēb͕ochi Ya, si, Ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism, Gì onwe-gi nābiakutekwam?

15 Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n’ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya.

16 Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya;

17 ma le, olu sitere n’elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.

Categories
MATIU

MATIU 4

1 Mb͕e ahu Mọ Nsọ duru Jisus rigo n’ọhia ka ekwensu we nwa Ya.

2 Mb͕e O busiri ọnu ọgu ubọchi abua ehihie na abali, emesia agu guru Ya.

3 Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha.

4 Ma Ọ zara, si, Edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu okwu nile ọ bula nke nēsi n’ọnu Chineke puta.

5 Mb͕e ahu ekwensu kuru Ya bà n’obodo nsọ; o we guzo Ya n’elu akuku ulo uku Chineke,

6 si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, tudà Onwe-gi n’ala: n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi:

Ọ bu kwa n’elu aka-ha ka ha gēburu gi,

Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya.

7 Jisus siri ya, Ọzọ kwa edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.

8 Ọzọ kwa, ekwensu kuru Ya ga ugwu di oké elu, we gosi Ya ala-eze nile nke uwa, na ebube-ha;

9 o we si Ya, Ihe ndia nile ka m’gēnye Gi, ọ buru na I gādà n’ala kpọ isi ala nyem.

10 Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.

11 Mb͕e ahu ekwensu rapu Ya; ma le, ndi-mọ-ozi biakutere Ya nējere Ya ozi.

12 Ma mb͕e Ọ nuru na arara Jọn nye, O wezugara Onwe-ya je Galili;

13 O we rapu Nazaret, bia biri na Kapanaum, nke di n’usọ osimiri, n’ókè-ala Zebulun na Naftali:

14 ka okwu ekwuru site n’ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,

15 Ala Zebulun na ala Naftali,

N’uzọ oké osimiri, n’ofè Jọdan,

Galili nke ndi-mba ọzọ,

16 Ndi ahu nke nānọdu n’ọchichiri

Huru oké ìhè,

Ndi nānọdu kwa n’ala na onyinyo ọnwu,

Ndia ka ìhè walitere.

17 Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n’ihi na ala-eze elu-igwe di nso.

18 Ma mb͕e Ọ nējeghari n’usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n’oké osimiri; n’ihi na ha bu ndi-ọkù.

19 O we si ha, Bianu som n’azu, M’gēme unu ndi-ọkù nākuta madu.

20 Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya.

21 O we si n’ebe ahu ga, hu umu-nne abua ọzọ, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, nime ub͕ọ-ha, ha na nna-ha Zebedi, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù; O we kpọ ha.

22 Ngwa ngwa ha we rapu ub͕ọ ahu na nna-ha, so Ya.

23 Jisus we nējeghari na Galili dum, nēzí ihe n’ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n’etiti ndi ahu.

24 Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike.

25 Ọtutu ìgwè madu we si na Galili na Dekapọlis na Jerusalem na Judia na n’ofè Jọdan so Ya.

Categories
MATIU

MATIU 5

1 Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu ahu, Ọ rigoro n’ugwu ahu: mb͕e Ọ nọduru ala, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya:

2 O we saghe ọnu-Ya, zí ha ihe, si,

3 Ngọzi nādiri ndi bu ob͕eye nime mọ-ha: n’ihi na ala-eze nke elu-igwe bu nke ndi ahu.

4 Ngọzi nādiri ndi nēru újú: n’ihi na ndi ahu ka agākasì obi.

5 Ngọzi nādiri ndi di nwayọ n’obi: n’ihi na ndi ahu gēketa uwa.

6 Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n’ihi na ndi ahu ka afọ gēju.

7 Ngọzi nādiri ndi-ebere: n’ihi na ndi ahu ka agēmere ebere.

8 Ngọzi nādiri ndi di ọcha n’obi: n’ihi na ndi ahu gāhu Chineke.

9 Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n’udo: n’ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke.

10 Ngọzi nādiri ndi esob͕uworo n’ihi ezi omume: n’ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi ahu.

11 Ngọzi nādiri unu mb͕e ọ bula ha nāta unu uta, nēsob͕u kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n’okwu-ugha, n’ihim.

12 Ṅurianu ọṅu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n’ihi na ugwọ-ọlu-unu di uku n’elu-igwe: n’ihi na otú a ka ha sob͕uru ndi-amuma ndi buru unu uzọ.

13 Unu onwe-unu bu nnú nke uwa: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ ghọ ezi nnú? ọ dighi kwa irè iji me ihe ọ bula ọzọ, ma-ọbughi ka etufue ya n’èzí, madu azọ ya ukwu.

14 Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apughi izo obodo nke ewuworo n’elu ugwu.

15 Ma ha adighi-amuye oriọna, dọba ya n’okpuru mb͕é, kama n’elu ihe-idọba-oriọna; ọ nēnwu-kwa-ra madu nile nọ n’ulo ahu.

16 Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n’iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n’elu-igwe.

17 Unu echèla na abiaram imebi iwu Chineke ma-ọbu ndi-amuma-Ya: abiaghm imebi, kama imezu ya.

18 N’ihi na n’ezie asim unu, Rue mb͕e elu-igwe na ala gāgabiga, ọ dighi otù ihe ọ bula dikarisiri ntà gāgabiga n’iwu ma-ọli, rue mb͕e ihe nile gēme.

19 Ya mere onye ọ bula nke gēmebi otù nime ihe ndia dikarisiri ntà nke enyere n’iwu, nke gēzí kwa madu otú ahu, agākpọ ya onye dikarisiri ntà n’ala-eze elu-igwe: ma onye ọ bula nke gēme ha, zí kwa ha, onye ahu ka agākpọ onye uku n’ala-eze elu-igwe.

20 N’ihi na asim unu, na ọ buru na ezi omume-unu adighi-akari ezi omume ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nke-uku, unu agaghi-abà n’ala-eze elu-igwe ma-ọli.

21 Unu nuru na agwara ndi-ochie, si, Eb͕ula madu; ma onye ọ bula nke b͕uru madu gēnye onwe-ya n’aka ikpé:

22 ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n’aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n’aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n’aka ọku ala-mọ.

23 Ya mere ọ buru na i nēche onyinye-gi n’iru Chineke n’ebe-ichu-àjà, i we cheta n’ebe ahu na nwa-nne-gi nwere ihe megide gi,

24 rapu onyinye-gi n’ebe ahu n’iru ebe-ichu-àjà, laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n’udo, mb͕e ahu bia kwa che onyinye-gi.

25 Me ka gi na onye nēkuru gi ga ikpé me eyì ọsọsọ, mb͕e gi na ya nọ n’uzọ; ka onye ahu nēkuru gi ga ikpe we ghara irara gi nye n’aka onye-ikpe ma eleghi anya, onye ikpe arara kwa gi nye n’aka onye nēje ozi, ewe tubà gi n’ulo-nkpọrọ.

26 N’ezie asim i, I gaghi-aputa n’ebe ahu ma-ọli, rue mb͕e i gākwughachi farthing ikpe-azu.

27 Unu nuru na ekwuru, si, Akwala iko:

28 ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwanyi anya ka agu ya we gua ya, ọ kwasiwo ya iko n’obi-ya ub͕u a.

29 Ma ọ buru na anya aka-nri gi eme gi ka i ma n’ọnyà, ghupu ya, tupu kwa ya n’aru-gi: n’ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n’aru la n’iyì, ka aghara kwa itubà aru-gi dum n’ọku ala-mọ.

30 Ma ọ buru na aka-nri-gi eme gi ka i ma n’ọnya, bipu ya, tupu kwa ya n’aru-gi: n’ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n’aru la n’iyì, ka aru-gi dum ghara kwa ije n’ọku ala-mọ.

31 Ekwu-kwa-ra, si, Nwoke ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ya nye ya akwukwọ nkewa:

32 ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n’ihi ikwa-iko, ọ nēme nwanyi ahu ka ọ nọ n’ọnọdu onye akwara iko megide: onye ọ bula nke gālu kwa ya mb͕e arapusiri ya, ọ nākwa iko.

33 Ọzọ kwa, unu nuru na agwara ndi-ochie, si, Aṅula iyí ugha, kama nyeghachi Onye-nwe-ayi ihe nile i ṅuru n’iyí:

34 ma Mu onwem si unu, Aṅula iyí ma-ọli; ejila elu-igwe ṅu, n’ihi na ọ bu oche-eze Chineke;

35 eji-kwa-la ala, n’ihi na ọ bu ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya; aṅukwala iyí n’ebe Jerusalem di, n’ihi na ọ bu obodo nke Eze uku ahu.

36 Eji-kwa-la isi-gi ṅu iyí, n’ihi na i pughi ime otù agiri-isi ka ọ di ọcha ma-ọbu ka ọ di oji.

37 Ma ka okwu-unu buru, E, e; É-è, é-è: ma ihe ọ bula kariri ndia nēsite n’ajọ onye ahu.

38 Unu nuru na ekwuru, si, Anya lara anya, ezé lara ezé:

39 ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ.

40 Ma ọ buru na onye ọ bula nāchọ ka gi na ya je ikpé, ka o we nara gi uwe-ime-gi, rapu-kwa-ra ya oké uwe-gi.

41 Onye ọ bula nke gējide gi ije otù mile, so ya je mile abua.

42 Nye onye nāriọ gi, ab͕akuta-kwa-la ya azú, bú onye nāchọ ka i binye ya ihe.

43 Unu nuru na ekwuru, si, Hu madu-ibe-gi n’anya, kpọ kwa onye-iro-gi asì:

44 ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n’anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu;

45 ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n’elu-igwe: n’ihi na Ọ nēme ka anyanwu-Ya nāwakwasi ajọ madu na ezi madu, Ọ nēme kwa ka miri zokwasi ndi ezi omume na ndi ajọ omume.

46 N’ihi na ùnu nwere ugwọ-ọlu gini, ma ọ buru na unu huru ndi ahu n’anya, bú ndi nāhu unu n’anya? ọbuná ndi-ọna-utu, hà adighi-eme otù ihe ahu?

47 Ọ buru kwa na unu nēkele nání umu-nne-unu, gini ka unu nēme kari ndi ọzọ? ọbuná ndi mba ọzọ, hà adighi-eme otù ihe ahu?

48 Ya mere unu onwe-unu gēzu okè, dika Nna-unu nke elu-igwe zuru okè.

Categories
MATIU

MATIU 6

1 Lezienu anya ka unu ghara ime ezi omume-unu n’iru madu, ka ha we kiri unu: ma unu emeghi otú a unu enweghi ugwọ-ọlu n’ebe Nna-unu Nke bi n’elu-igwe nọ.

2 Ya mere, mb͕e ọ bula i nālu ọlu ebere, afùla opì n’iru gi, ọbuná dika ndi-iru-abua nēme n’ulo-nzukọ-unu na n’uzọ-unu, ka ha we nara otuto n’aka madu. N’ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.

3 Ma mb͕e i nālu ọlu ebere, ka aka-ekpe-gi ghara ima ihe aka-nri-gi nēme:

4 ka ọlu ebere gi we di na nzuzo: Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi.

5 Mb͕e ọ bula unu nēkpe kwa ekpere, unu agaghi-adi ka ndi-iru-abua ahu: n’ihi na ọ nātọ ha utọ iguzo n’ulo-nzukọ-unu na nkuku amá-unu ikpe ekpere, ka ha we were onwe-ha gosi madu. N’ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.

6 Ma gi onwe-gi, mb͕e ọ bula i nēkpe ekpere, bà n’ime-ulo ntà gi, mb͕e i mechisi-kwa-ra uzọ-gi, kpere Nna-gi Nke di na nzuzo, Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi.

7 Ma mb͕e unu nēkpe ekpere, unu ekwula okwu-nkwukwasi efù, dika ndi mba ọzọ nēme: n’ihi na ha nēchè na agānu olu-ha n’ọtutu okwu ha nēkwu.

8 Ya mere, unu eyila ha: n’ihi na Nna-unu matara ihe nile di unu nkpà, mb͕e unu akāriọghi Ya.

9 Ya mere, kpenu ekpere otú a: Nna-ayi Nke bi n’elu-igwe, Ka edo aha-Gi nsọ.

10 Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe nāchọ, dika esi eme ya n’elu-igwe, ka eme kwa otú ahu n’uwa.

11 Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n’ubọchi ta.

12 B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ.

13 Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n’aka ajọ onye ahu.

14 N’ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu.

15 Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu.

16 Ọzọ, mb͕e ọ bula unu nēbu ọnu, unu aghọla ndi nāb͕aru iru, dika ndi-iru-abua: n’ihi na ha nēmebi iru-ha, ka ha were onwe-ha gosi madu na ha nēbu ọnu. N’ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.

17 Ma gi onwe-gi, mb͕e i nēbu ọnu, were manu te n’isi-gi, sa kwa iru-gi;

18 ka i ghara igosi madu onwe-gi na i nēbu ọnu, kama gosi Nna-gi Nke di na nzuzo: Nna-gi, Nke nāhu ihe na nzuzo, gēnyeghachi kwa gi.

19 Unu akpadola àkù n’uwa nye onwe-unu, ebe nla na nchala nērichapu, ebe ndi-ori nēgwupú kwa nēzu kwa ori:

20 kama kpadonu àkù n’elu-igwe nye onwe-unu, ebe nla ma-ọbu nchala nādighi-erichapu, ebe ndi-ori nādighi-egwupú kwa, ha adighi-ezu kwa ori:

21 n’ihi na ebe àkù-gi di, n’ebe ahu ka obi-gi gādi kwa.

22 Oriọna nke aru bu anya: ya mere ọ buru na anya-gi ele otù ebe, aru-gi dum gējuputa n’ìhè.

23 Ma ọ buru na anya-gi jọrọ njọ, aru-gi dum gējuputa n’ọchichiri. Ya mere, ọ buru na ìhè nke di nime gi bu ọchichiri, le ka ọchichiri ahu si di oké ibù!

24 Ọ dighi onye ọ bula puru ibu orù nke nna abua: n’ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n’anya; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.

25 N’ihi nka ka M’ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri, ma-ọbu ihe unu gāṅu; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. Ọ̀ bughi ndu kariri ihe eji azù ya, ọ̀ bughi kwa aru kariri uwe-oyiyi-ya?

26 Lenu anu-ufe nke elu-igwe, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewè kwa ihe-ubi, ha adighi-ekpokọta kwa ihe ba n’ọba; ma Nna-unu nke elu-igwe nāzù ha. Ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari ha?

27 Ma ònye n’etiti unu puru itukwasi otù cubit n’ogologo-ya site n’icheb͕u onwe-ya?

28 Gini mere unu nēcheb͕u kwa onwe-unu nye uwe-oyiyi? Ribanu urodi nke ubi ámá, otú ha nētó etó; ha adọb͕ughi onwe-ha n’ọlu, ha atughi kwa ogho:

29 ma asim unu, na ọbuná Solomon n’ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia.

30 Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia nke ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n’ite ọku, Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà?

31 Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu, si, Gini ka ayi gēri? ma-ọbu, Gini ka ayi gāṅu? ma-ọbu, Gini ka agēji b͕okwasi ayi?

32 N’ihi na ihe ndia nile ka ndi mba ọzọ nāchọ; n’ihi na Nna-unu nke elu-igwe nāmata na ihe ndia nile di unu nkpà.

33 Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.

34 Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu nye echi: n’ihi na echi gēcheb͕uru onwe-ya. Ihe ọjọ nke ubọchi ta ezuworo ya.

Categories
MATIU

MATIU 7

1 Unu ekpela ikpé, ka aghara ikpe unu ikpé.

2 N’ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu.

3 Ma gini mere i ji le irighiri ahihia nke di n’anya nwa-nna-gi, ma i tugharighi uche na ntuhie nke di n’anya nke gi?

4 Ma-ọbu ì gēsi aṅa si nwa-nna-gi, Kwe ka m’tupu irighiri ahihia ahu n’anya-gi: ma le, ntuhie ahu di n’anya nke gi?

5 Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n’anya nke gi; mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu n’anya nwa-nna-gi.

6 Unu enyela nkita ihe di nsọ, unu atuda-kwa-la pearl-unu n’iru ezì, ka ha ghara izọkwasi ha n’ukwu-ha ma eleghi anya, we chigharia, dọka unu.

7 Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu:

8 n’ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere.

9 Ma -ọbu òle madu di n’etiti unu, onye, ma ọ buru na nwa-ya gāriọ ya ob͕e achicha, gēnye ya nkume;

10 ma-ọbu asi na ọ gāriọ azù, gēnye ya agwọ?

11 Ya mere, ọ buru na unu onwe unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu Nke bi n’elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari ezi ihe nke-uku nye ndi nāriọ Ya?

12 Ya mere ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu: n’ihi na nka bu iwu na ndi-amuma Chineke.

13 Sinu n’ọnu-uzọ di warara bà: n’ihi na obosara ka ọnu-uzọ ahu di, mbara ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà n’ila-n’iyì, ọtutu ka ha di kwa, bú ndi nēsi na ya nābà.

14 N’ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya.

15 Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n’ihe-oyiyi aturu, ma n’ime ha bu agu nāpunara aturu.

16 Unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha. Màdu nēkpokọputa nkpuru-vine n’ogwu, ma-obu fig n’uké?

17 Otú a ezi osisi ọ bula nāmi nkpuru ọma; ma osisi nābaghi n’ihe nāmi ajọ nkpuru.

18 Ezi osisi apughi imi ajọ nkpuru, osisi nābaghi n’ihe apughi kwa imi nkpuru ọma.

19 Anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.

20 Ya mere unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha.

21 Ọ bughi onye ọ bula nke nāsim, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, gābà n’ala eze elu-igwe; kama ọ bu onye nēme ihe Nnam Nke bi n’elu-igwe nāchọ.

22 Ọtutu madu gāsim n’ubọchi ahu, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, àyi jiri aha-Gi bu amuma, àyi jiri kwa aha-Gi chupu ndi-mọ ọjọ, àyi jiri kwa aha-Gi lu ọtutu ọlu di ike?

23 Ma mb͕e ahu ka M’gēkwuputara ha, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula M’mara unu: si n’ebe M’nọ pua, unu ndi nālu ọlu nēmebi iwu.

24 Ya mere onye ọ bula nke nānu okwum ndia, nēme kwa ha, agēji ya tuyere nwoke nwere uche, onye wuru ulo-ya n’elu oké nkume:

25 miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we makwasi ulo ahu; ma ọ dagh: n’ihi na atọrọ ntọ-ala-ya n’elu oké nkume ahu.

26 Ma onye ọ bula nke nānu okwum ndia, ma ọ dighi-eme ha, agēji ya tuyere nwoke nke bu onye-nzuzu, onye wuru ulo-ya n’elu ájá:

27 miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we tikwasi ulo ahu; o we da: ọdida-ya di kwa uku.

28 O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia, ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n’aru:

29 n’ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ-ha.

Categories
MATIU

MATIU 8

1 Ma ka O siri n’ugwu ahu ridata, oké ìgwè madu soro Ya.

2 Ma le, onye-ekpenta biakutere Ya. nākpọ isi ala nye Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m’di ọcha.

3 O we setipu aka-Ya, metu ya, si, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. Ngwa ngwa ewe me ka ọ di ọcha n’ekpenta-ya.

4 Jisus we si ya, Lezi anya ka i ghara igwa onye ọ bula okwu; ma laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n’iru Chineke onyinye ahu Moses nyere n’iwu, ka ọ buru ha àmà.

5 Mb͕e Ọ batara na Kapanaum, otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise biakutere Ya, nāriọ Ya,

6 si, Onye-nwe-ayi, onye nējerem ozi tọb͕ọrọ n’ulom, akuku-aru-ya nwuru anwu, anēmekpa ya aru gabiga ókè.

7 O we si ya, Mu onwem gābia me ka aru di ya ike.

8 Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise zara, si, Onye-nwe-ayi, erughm ka I ba n’okpuru ulom: kama were nání okwu-ọnu kwue, agēme kwa ka aru onye nējerem ozi di ike.

9 N’ihi na mu onwem bu kwa onye nọ n’okpuru ike, nēnwe ndi-agha n’okpuru mu onwem: m’we si onye a, Ga, ọ ga; m’si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m’si kwa orùm, Me nka, o me ya.

10 Ma mb͕e Jisus nuru nka, o juru Ya anya, Ọ, we si ndi n’eso ya n’azu, N’ezie asim unu, Ọ dighi mb͕e M’huru oké okwukwe di otú a n’aru onye ọ bula n’Israel.

11 Ma asim unu, na ọtutu madu gēsi n’Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu bia, so kwa Abraham, na Aisak, na Jekob, nānọdu n’ala-eze elu-igwe:

12 ma agāchupu umu ala-eze ahu bà n’ọchichiri nke èzí: n’ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

13 Jisus we si ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, Laba; dika i kwere, ka emere gi. Ewe me ka aru onye nējere ya ozi di ike n’oge hour ahu.

14 Mb͕e Jisus batasiri n’ulo Pita, O we hu nne nwunye-ya ka ọ tọb͕ọrọ n’aru-ọku.

15 O we metu aka-ya, aru-ọku ahu we rapu ya; o we bilie, nēje-kwa-ra Ya ozi.

16 Ma mb͕e o ruru anyasi, ha kutara Ya ọtutu madu ndi mọ ọjọ ji: O we were okwu-ọnu chupu ndi-mọ ahu, me kwa ndi nile aru nādighi nma ka aru-ha di ike:

17 ka okwu ekwuru site n’ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si, Ya onwe-ya nara nriaria nile ayi, būru kwa ọria nile ayi.

18 Ma mb͕e Jisus huru na ọtutu ìgwè madu di Ya buruburu, O kwuru ka ha gabiga n’ofè ọzọ.

19 Otù ode-akwukwọ we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, m’gēso Gi ebe ọ bula I nēje.

20 Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.

21 Onye ọzọ n’etiti ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Onye-nwe-ayi, kwe ka m’buru uzọ je lìe nnam.

22 Ma Jisus si ya, Som; rapu kwa ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu.

23 Mb͕e Ọ batara n’ub͕ọ, ndi nēso uzọ-Ya we so Ya.

24 Ma le, oké ajọ ifufe febe n’oké osimiri, ya mere ebili-miri nēkpuchi ub͕ọ-ha: ma Ya onwe-ya nāraru ura.

25 Ha we biakute Ya, kpọte Ya, si, Onye-nwe-ayi, zọputa ayi; ayi nāla n’iyì.

26 O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ, unu ndi okwukwe ntà? Mb͕e ahu O biliri, bara ifufe na oké osimiri ahu nba; oké ndaju we di.

27 Ibobo we nwua ndi ahu n’aru, ha si, Àha madu gini ka Onye a bu, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?

28 Mb͕e Ọ gabigasiri n’ofè ọzọ n’ala ndi Gadara, ndikom abua ndi mọ ọjọ ji we zute Ya, ndi nēsi n’ebe anēlì ozu puta, ndi anya-ha di oké egwu, ya mere ọ dighi onye ọ bula nwere ike igabiga uzọ ahu.

29 Ma le, ha tiri nkpu, si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Gi Ọkpara Chineke? Ì biara ebe a imekpa ayi aru mb͕e oge-ayi akērughi?

30 Ma ìgwè nke ọtutu ezì di n’ebe di anya n’ebe ha nọ, nāta nri.

31 Ndi-mọ ọjọ ahu we riọ Ya, si, Ọ buru na I chupuru ayi, ziga ayi nime ìgwè ezì ahu.

32 O we si ha, Labanu. Ha we puta, je ba n’ìgwè ezì ahu: ma le, ìgwè ezì ahu nile nudara n’ebe ahu di nkputankpu dabà n’oké osimiri, nwua nime miri.

33 Ndi nāzù ha we b͕alaga, we je ba n’obodo ahu, kọsa ihe nile, ya na ihe mere ndi ahu ndi-mọ ọjọ ji.

34 Ma le, obodo ahu nile putara izute Jisus: ma mb͕e ha huru Ya, ha riọrọ Ya ka Ọ pua n’ókè-ala-ha.

Categories
MATIU

MATIU 9

1 O we ba nime ub͕ọ, gabiga n’ofè ọzọ, bia n’obodo nke aka Ya.

2 Ma le, ha butere Ya onye akuku-aru-ya nwuru anwu, tọb͕ọrọ n’ihe-ndina: mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, nwe obi-ike; anāb͕aghara gi nmehie-gi nile.

3 Ma le, ufọdu n’etiti ndi-ode-akwukwọ kwuru nime onwe-ha, si, Nwoke a nēkwulu Chineke.

4 Ma Jisus, ebe ọ mara ihe nile di ha n’obi, Ọ si, Gini mere unu nēchè ajọ ihe n’obi-unu?

5 N’ihi na, òle nke ka nfe, isi, Anāb͕aghara gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, jeghari kwa?

6 Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n’elu uwa ib͕aghara nmehie (mb͕e ahu Ọ siri onye ahu ukwu-ya nwuru anwu), Bilie, chiri ihe-ndina-gi, la n’ulo-gi.

7 O we bilie, la n’ulo-ya.

8 Ma mb͕e ìgwè madu nile huru ya, ha turu egwu, we nye Chineke otuto, Onye nyere madu ike di otú a.

9 Mb͕e Jisus nēsi n’ebe ahu nāga, Ọ huru otù nwoke, anākpọ Matiu, ka ọ nọduru n’ulo-ùtú: Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya.

10 O rue, mb͕e Ọ nọduru na nri n’ulo-ya, le, ọtutu ndi-ọna-utu na ndi-nmehie biara so Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri.

11 Mb͕e ndi-Farisi huru ya, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, N’ìhi gini ka Onye-ozizí-unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia eri ihe?

12 Ma mb͕e Ọ nuru ya, Ọ si, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpà ndi aru nādighi nma.

13 Ma ganu muta ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà: n’ihi na abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie.

14 Mb͕e ahu ndi nēso uzọ Jọn biakutere Ya, si, N’ìhi gini ka ayi onwe-ayi na ndi-Farisi nēbu ọnu ọtutu mb͕e, ma ndi nēso uzọ-Gi adighi-ebu ọnu?

15 Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru iru újú ka oge ahu ra, bú mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ma ubọchi gābia, mb͕e agānapu ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu kwa ọnu.

16 Ọ dighi kwa onye ọ bula nēwere iberibe ákwà ọb͕ub͕a ọhu tukwasi n’uwe ochie; n’ihi na nke kwesiri ímechi ya nādọkapu ihe n’aru uwe ahu, ndọka jọkariri njọ aputa.

17 Ha adighi-ab͕aye kwa manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, karama-akpukpọ ahu ab͕awa, manya-vine ahu we wusì, karama-akpukpọ ahu ala kwa n’iyì: ma ha nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu, anēdebe ha abua nke-ọma.

18 Mb͕e Ọ nāgwa ha okwu ndia, le, otù onye-isi biara, we kpọ isi ala nye Ya, si, Nwam nwayi anwuruwo ọbuná ub͕u a: otú ọ di, bia bikwasi ya aka-Gi, na ọ gādi ndu.

19 Jisus we bilie, so ya je, ndi nēso uzọ-Ya so-kwa-ra.

20 Ma le, otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, biara n’azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka:

21 n’ihi na ọ nāsi n’onwe-ya, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam.

22 Ma Jisus chighariri, we hu ya, si, Nwam nwanyi, nwe obi-ike; okwukwe-gi azọputawo gi. Ewe site n’oge hour ahu zọputa nwanyi ahu.

23 Mb͕e Jisus biara n’ulo onye-isi ahu, hu ndi-ọkwa-ọ̀jà, na ìgwè madu ka ha nātu ùzù,

24 Ọ si, Wezuganu onwe-unu; n’ihi na nwa-ab͕ọghọ ntà ahu anwughi anwu, kama ọ nāraru ura. Ha we chìa Ya ọchì.

25 Ma mb͕e achupuru ìgwè madu ahu, Ọ ba nime, jide ya n’aka; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie.

26 Ùdé a we pua gazue n’ala ahu dum.

27 Mb͕e Jisus nēsi n’ebe ahu nāga, ndi-ìsì abua we so Ya, nēti nkpu, si, Mere ayi ebere, Nwa Devid.

28 Ma mb͕e Ọ batasiri n’ulo, ndi-ìsì ahu biakutere Ya: Jisus we si ha, Ùnu kwere na apurum ime ihe a? Ha si Ya, E, Onye-nwe-ayi.

29 Mb͕e ahu O meturu anya-ha aka, si, Dika okwukwe-unu si di ka emere unu.

30 Ewe saghe anya-ha. Jisus we dọ ha aka na nti nke-uku, si, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara ima ya.

31 Ma ha puru, b͕asa ùdé-Ya n’ala ahu dum.

32 Mb͕e ha nāpu, le, ekutara Ya onye-ob͕i nke mọ ọjọ ji.

33 Mb͕e achupusiri mọ ọjọ ahu, onye-ob͕i ahu we kwue okwu: ibobo we nwua ìgwè madu nile n’aru, ha si, Ọ dighi mb͕e ọ bula egosiri ya otú a n’Israel.

34 Ma ndi-Farisi nāsi, N’ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.

35 Jisus we nējeghari n’obodo na obodo ntà ha nile, nēzí ihe n’ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.

36 Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu nile, O nwere ọmiko n’aru ha, n’ihi na anēsob͕u ha, nāchusa kwa ha, dika aturu nēnweghi onye nāzù ha.

37 Mb͕e ahu Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Owuwe-ihe-ubi riri nne n’ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole.

38 Ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu bà n’owuwe-ihe-ubi-Ya.

Categories
MATIU

MATIU 10

1 O we kpọ ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, O nye ha ike n’ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ, ichupu ha, na igwọ ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.

2 Ma aha ndi-ozi iri na abua ahu bu ndia: Onye mbu, Saimon, onye anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya; na Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya;

3 Filip, na Batọlọmiu; Tomas, na Matiu onye-ọna-utu; Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs;

4 Saimon Kananiọs, na Judas Iskariot, onye ra-kwa-ra Ya nye.

5 Ndikom iri na abua ahu ka Jisus zipuru, O we nye ha iwu, si,

Unu ejela n’uzọ ndi mba ọzọ, unu abà-kwa-la n’obodo ndi Sameria:

6 kama jekurunu aturu furu efu nke ulo Israel.

7 Mb͕e unu nāga, nēkwusanu, si, Ala-eze elu-igwe di nso.

8 Menu ndi aru-ha nādighi ike ka aru di ha ike, menu ndi nwuru anwu ka ha si n’ọnwu bilie, menu ndi-ekpenta ka ha di ọcha, chupunu ndi-mọ ọjọ: n’efu ka unu natara, nyenu n’efu.

9 Unu anatala ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu ọla itiye n’ihe-ọkiké-unu;

10 unu anatala àkpà iwere ga ije-unu, ma-ọbu uwe-ime abua, ma-ọbu akpukpọ-ukwu, ma-ọbu nkpa-n’aka: n’ihi na onye-ọlu kwesiri ihe eji azù ya.

11 Ma obodo ọ bula ma-ọbu obodo ntà ọ bula unu gābà nime ya, chọputanu onye kwesiri nime ya; nọgidenu n’ebe ahu rue mb͕e unu putara.

12 Mb͕e unu nābà n’ulo ahu, kelenu ya.

13 Ọ buru kwa na ulo ahu kwesiri, ka udo-unu biakwasi ya: ma ọ buru na o kwesighi, ka udo-unu laghachikute unu ọzọ.

14 Ma onye ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, nke nānughi kwa okwu nile unu, mb͕e unu nāpu n’ulo ahu ma-ọbu n’obodo ahu, tichapu ájá ukwu-unu.

15 N’ezie asim unu, Ala Sọdọm na Gọmọra gānagide okwu n’ubọchi ikpé kari obodo ahu.

16 Le, Mu onwem nēzipu unu dika aturu n’etiti agu: ya mere, burunu ndi nwere uche dika agwọ, ndi nādighi kwa aghughọ dika nduru.

17 Ma nēzenu madu: N’ihi na ha gārara unu nye n’aka nnọkọ-ikpé di iche iche, n’ulo-nzukọ nile ha ka ha gāpia kwa unu ihe;

18 e, n’iru ndi-isi na ndi-eze ka agēkuru kwa unu je n’ihim, iburu ha na ndi mba ọzọ àmà.

19 Ma mb͕e ọ bula ha gārara unu nye, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gēkwu ma-ọbu okwu unu gēkwu: n’ihi na agēnye unu n’oge hour ahu okwu unu gēkwu.

20 N’ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ nke Nna-unu Nke nēkwu nime unu.

21 Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n’ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye: umu gēbili kwa megide ndi muru ha, me ka ha nwua anwu.

22 Madu nile gākpọ kwa unu asì n’ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.

23 Ma mb͕e ọ bula ha sob͕uru unu n’obodo a, b͕alaga n’obodo di iche: n’ihi na n’ezie asim unu, Unu agaghi-agazù obodo nile nke Israel ma-ọli, rue mb͕e Nwa nke madu gābia.

24 Onye nēso uzọ onye-ozizí adighi-aka onye-ozizí-ya, orù adighi-aka kwa onye-nwe-ya.

25 O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya. Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebul, hà gēsi aṅa ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Ya kari nke-uku?

26 Ya mere, unu atula egwu ha: n’ihi na ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe; ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama.

27 Okwu M’nāgwa unu n’ọchichiri, kwuenu ya n’ìhè: ihe unu nānu kwa na nti, kwusanu ya n’elu ulo.

28 Unu atu-kwa-la egwu ndi nēb͕u aru, ma ha apughi ib͕u nkpuru-obi: kama nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n’iyì n’ọku ala-mọ.

29 Àdighi-ere egwele abua n’otù penny? ma otù nime ha agaghi-adà n’ala ma Nna-unu ekwegh:

30 ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo.

31 Ya mere, unu atula egwu; ọnu-ahia unu onwe-unu kariri nke ọtutu egwele.

32 Ya mere, onye ọ bula nke gēkwuputam n’iru madu, ya ka Mu onwem gēkwuputa kwa n’iru Nnam Nke bi n’elu-igwe.

33 Ma onye ọ bula nke gāgọnarim n’iru madu, ya ka Mu onwem gāgọnari kwa n’iru Nnam Nke bi n’elu-igwe.

34 Unu echèla na abiaram itubà udó n’elu uwa: abiaghm itubà udó, kama ọ bu mma-agha.

35 N’ihi na abiaram ikewa nwoke megide nna-ya, na nwa-nwanyi megide nne-ya, na nwunye nwa megide nne di-ya:

36 ọ bu kwa ndi èzí-na-ulo madu gābu ndi-iro-ya.

37 Onye nāhu nna-ya ma-ọbu nne-ya n’anya kari Mu adighi-ekwesim; onye nāhu kwa nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwanyi n’anya kari Mu adighi-ekwesim.

38 Onye nānaraghi kwa obe-ya sokwam n’azu, adighi-ekwesim.

39 Onye chọtara ndu-ya gētufu ya; onye tufu-kwa-ra ndu-ya n’ihim gāchọta ya.

40 Onye nānara unu nke-ọma, ọ bu Mu ka ọ nānara nke-ọma, onye nānara kwa Mu onwem nke-ọma nānara Onye ziterem nke-ọma.

41 Onye nānara onye-amuma nke-ọma n’aha onye-amuma gānara ugwọ-ọlu onye-amuma; onye nānara kwa onye ezi omume nke-ọma n’aha onye ezi omume gānara ugwọ-ọlu onye ezi omume.

42 Onye ọ bula nke gēkuru nání iko miri oyi nye otù onye nime ndi ntà ndia ṅua n’aha onye nēso uzọm, n’ezie asim unu, ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.