Categories
MALAKAI

MALAKAI 1

1 Ibu okwu Jehova eboro Israel site n’aka Malakai.

2 Ahuwom unu n’anya, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka I huworo ayi n’anya? Isọ, ọ̀ bughi nwa-nne Jekob? (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): otú ọ di, anamahu Jekob n’anya;

3 ma Isọ ka M’kpọworo asì, me ugwu-ya nile ka ha ghọ ebe tọḅọrọ n’efu, M’were ihe-nketa-ya nye nkita-ọhia nile nke ọzara.

4 Ọ bu ezie na Edom nāsi, Etituwo ayi, ma ayi gēwughachi nkpọnkpọ ebe nile; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ndi ahu gēwu, ma Mu onwem gākwatu: agākpọ kwa ha Ókè-ala nmebi-iwu, na Ndi ahu nke Jehova wesaworo oké iwe rue mḅe ebighi-ebi.

5 Anya-unu gāhu kwa, unu onwe-unu gāsi kwa, Jehova di uku rue ofè ókè-ala Israel.

6 Nwa nāsọpuru nna-ya, orù nāsọpuru kwa onye-nwe-ya: ọ buru kwa na nna ka M’bu, òle ebe nsọpurum di? ọ buru kwa na onye-nwe-madu ka M’bu, òle ebe egwum di? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri unu, unu ndi-nchu-àjà, ndi nēlelì aham. Ma unu asiwo, Nìme gini ka ayi lelìworo aha-Gi?

7 Unu nēweta nso achicha emere ka ọ ghara idi nsọ n’elu ebe-ichu-àjàm. Ma unu nāsi, Nìme Gini ka ayi meworo Gi ka I ghara idi nsọ? N’isi, Table nke Jehova, ihe nlelì ka ọ bu.

8 Ọzọ, mḅe unu nēweta anu kpuru ìsì nso, ihe ọjọ adighi ya! mḅe unu nēweta nso nke gwọrọ ngwurọ na nke nāria ọria, ihe ọjọ adighi ya! Biko, weta ya nso onye nāchi ala-gi; ìhe-gi gātọ ya utọ? ma-ọbu ọ̀ gāhu gi iru-ọma? otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

9 Ma uḅu a, biko, menu ka iru Chineke dajua, ka O we mere ayi amara: ọ bu site n’aka-unu ka nka diworo: Ọ̀ gāhu onye ọ bula nime unu iru-ọma? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri:

10 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na otù onye di n’etiti unu nke nēmechi uzọ, ka unu we ghara ifunwu ọku nke ebe-ichu-àjàm n’efu! ọ dighi ihe-unu nātọm utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M’gaghi-anara kwa onyinye-inata-iru-ọma n’aka-unu nke-ọma.

11 N’ihi na site n’ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n’etiti mba nile; ọ bu kwa n’ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n’ihi na aham di uku n’etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

12 Ma unu onwe-unu nēme ka ọ ghara idi nsọ, n’isi, Table nke Jehova, ihe emere ka ọ ghara idi nsọ ka ọ bu, nkpuru-ya, bú ihe-oriri-Ya, bu kwa ihe-nlelì.

13 Unu asiwo kwa, Le, ka o si buru oké ike-ọgwugwu! unu afùwo kwa ya na nlelì, ka Jehova nke ndi-agha siri; unu ewebatawo kwa ihe anapuru n’ike, na ihe gwọrọ ngwuro, na nāria ọria; otú a ka unu webataworo onyinye-inata-iru-ọma: #M’gānara nka nke-ọma nāka-unu? ka Jehova siri.

14 Ma onye anābu ọnu ka onye-nghọḅu ahu bu, nke oké di n’ìgwè aturu-ya, ma ọ nēkwe nkwa, we chuara Onye-nwe-ayi àjà ihe biriri ebibi: n’ihi na eze uku ka M’bu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, aham di kwa egwu n’etiti mba nile.

Categories
MALAKAI

MALAKAI 2

1 Ma uḅu a, unu ka ihe a enyere n’iwu diri, unu ndi-nchu-àjà.

2 Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n’obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M’gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n’aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n’ihi na unu adighi-etiye ya n’obi.

3 Le, M’gaje ibasiri nkpuru-ọghigha nba ike n’ihi unu, fesa unu ǹsí-anu n’iru, bú ǹsí-anu nke anu ememe nile unu; agēbupu unu je n’ebe ọ di.

4 Unu ewe mara na eziteworom unu ihe a enyere n’iwu, ka ọḅuḅa-ndum we diyere Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

5 Ọgbugha-ndum diyere ya, bú ndu na udo; M’we nye ya ha dika ihe-egwu, o we tua egwum, ọ bu kwa aham ka ya onwe-ya turu ujọ ya.

6 Iwu nke ezi-okwu di n’ọnu-ya, ahughi kwa ajọ omume n’eḅuḅere-ọnu-ya: n’udo na n’izi-ezi ka o sorom je ije, ọ di kwa ọtutu madu o mere ka ha si n’ajọ omume chigharia.

7 N’ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n’ọnu-ya: n’ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.

8 Ma unu onwe-unu ewezugawo onwe-unu n’uzọ Chineke; unu emewo ka ọtutu madu su ngọngọ n’iwu; unu ebibiwo ọḅuḅa-ndu Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

9 Ma Mu onwem emewo kwa ka unu buru ndi anēlelì na ndi di ala n’iru ndim nile, dika unu nādighi-esi edebe uzọm nile, kama unu nāhu madu iru-ọma n’iwu.

10 Ọ̀ bughi otù Nna ka ayi nile nwere? ọ̀ bughi otù Chineke keworo ayi? gini mere ayi nāghọḅu, onye ọ bula ọ ghọḅu ibe-ya, nēme ka ọḅuḅa-ndu nna-ayi-hà ghara idi nsọ?

11 Juda aghọḅuwo nghọḅu, ọ bu kwa ihe-árú ka emeworo n’Israel na nime Jerusalem; n’ihi na Juda emewo ka idi-nsọ Jehova nke Ọ huworo n’anya ghara idi nsọ, ọ luwo kwa nwa-nwan yi nke chi ala ọzọ.

12 Jehova gēbipuru onye ahu nke nēme nka onye nēteta eteta na onye nāza aza, n’ulo-ikwū nile nke Jekob, ya na onye nēwetara Jehova nke usu nile nke ndi-agha nso onyinye-inata-iru ọma.

13 Ọ bu kwa nka nke mere ya abua ka unu nēme: unu ji anya-miri na ikwa-ákwá na isu-udè ekpuchi ebe-ichu-àjà Jehova, O we ghara iche kwa onyinye-inata-iru-ọma ọzọ, ọ tọghi kwa Ya utọ inara ya n’aka-unu.

14 Ma unu asiwo, N’ìhi gini? N’ihi na Jehova aburuwo onye-àmà n’etiti gi na nwunye i lutara n’okorọbia, onye gi onwe-gi ghọḅuworo, ọ bu ezie na ya onwe-ya bu nwan yi ejikọtara gi na ya, na nwunye ọḅuḅa-ndu-gi.

15 Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N’ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n’okorọbia.

16 N’ihi na Ọ kpọwo nchupu-nwunye asì, otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, ya na onye ji ihe-ike ekpuchi uwe-ya, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: n’ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka unu we ghara ighọḅu.

17 Unu ejiwo okwu nile unu me ka ike gwu Jehova. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi meworo ka ike gwu Ya? N’isi, Onye ọ bula nke nēme ihe ọjọ di nma n’anya Jehova, ọ bu kwa ihe-ha nātọ Ya onwe-ya utọ; ma-ọbu òle ebe Chineke nke ikpé nọ?

Categories
MALAKAI

MALAKAI 3

1 Le, Mu nēziga onye-ozim, o gēdozi kwa uzọ n’irum Onye-nwe-unu ahu unu onwe-unu nāchọ gābiaru ulo uku Ya na mberede; ọbuná Onye-ozi ọḅuḅa-ndu ahu, Onye ihe-Ya nātọ unu utọ, le Ọ nābia, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

2 Ma ònye gānagide ubọchi ọbibia-Ya? ọ̀ bu kwa onye ganēguzogide mḅe anāhu Ya anya? n’ihi na Ya onwe-ya di ka ọku onye-nnucha-ihe na dika nchà nke ọsu-ákwà:

3 Ọ gānọdu kwa ala dika onye-nnucha ọla-ọcha nke nēme ka ọ di ọcha, Ọ gēme kwa ka umu Livai di ọcha, sicha kwa ha dika ọla-edo na ọla-ọcha; ha ganēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma n’ezi omume.

4 Onyinye-inata-iru-ọma nke Juda na Jerusalem gātọ kwa Jehova utọ, dika n’ubọchi mḅe ebighi-ebi gara aga, na dika n’arọ nile gara aga.

5 M’gābiakute unu nso ikpe ikpé; M’gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n’ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n’ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

6 N’ihi na Mu onwem, bú Jehova, aḅanweghi; ya bu na emeghi ka unu onwe-unu gwusia, umu Jekob.

7 Site n’ubọchi nile nke nna-unu-hà ka unu wezugaworo onwe-unu n’ukpurum nile, unu edebeghi kwa ha. Laghachikutenum, Mu onwem gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi gālaghachi?

8 Madu, ọ̀ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N’otù uzọ n’uzọ iri nile na àjà-nbuli nile.

9 Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bú mba nka nile.

10 Webatanu otù uzọ n’uzọ iri nile n’ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n’ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M’gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya.

11 M’gābasi-kwa-ra ihe nēripia eripia nba ike n’ihi unu, ọ gaghi-ebibi-kwa-ra unu nkpuru ala-ubi-unu; osisi vine unu agaghi-atupu nkpuru-ya n’ubi tutu oge-ya eru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

12 Ọ bu kwa Ndi ihe nāgara nke-ọma ka mba nile gākpọ unu: n’ihi na unu onwe-unu gābu ala nke nātọ utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

13 Okwu nile unu adiwo ike imegidem, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Gini ka ayi kwuritaworo megide Gi?

14 Unu asiwo, Ọ bu ihe-efu ifè Chineke òfùfè: ọ̀ bu kwa urù gini ka ọ bara ayi na ayi edebewo ihe-ndebe-Ya, na ayi ejeghariwo kwa n’uwe-iḅa-nkpe n’iru Jehova nke usu nile nke ndi-agha?

15 Ma uḅu a ayi onwe-ayi nākpọ ndi-nganga ndi ihe nāgara nke-ọma; e, anēwu ndi nēme ihe-nmebi-iwu dika ulo; e, ha anwawo Chineke, ewe me ka ha wepuga onwe-ha.

16 Mḅe ahu ndi nātu egwu Jehova nēkwurita okwu, otú onye na ibe-ya: Jehova we ṅa nti, nu, ewe dere ndi nātu egwu Jehova, ndi nēchè kwa èchìchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n’iru Ya.

17 Ha gābu kwa nkem, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, n’ubọchi ahu mḅe Mu onwem ganēme ihe, bú ihe nke akam; M’gēnwe kwa ọmiko n’aru ha, dika madu si enwe ọmiko n’aru nwa-ya nke nēfè ya.

18 Unu gālaghachi kwa hu ihe di iche n’etiti onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n’etiti onye nēfè Chineke na onye nādighi-efè Ya.

Categories
MALAKAI

MALAKAI 4

1 N’ihi na, le, ubọchi ahu nābia, ọ nēre dika ite-ọku uku; ndi-nganga nile na onye ọ bula nke nēme ihe-nmebi-iwu gābu kwa ahihia-ọka: ubọchi ahu nke nābia gērechapu ha, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ọ gaghi-arapu-kwa-ra ha nkpọrọgwu ma-ọbu alaka.

2 Ma unu ndi nātu egwu aham ka anyanwu nke ezi emume gāwara, ọgwugwọ di kwa na nkù; unu gāpu kwa, wulie elu dika umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba.

3 Unu gāzọda kwa ndi nēmebi iwu; n’ihi na ha gābu ntu n’okpuru ọbu-ukwu-unu n’ubọchi ahu mḅe M’gēme ihe, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

4 Chetanu iwu Moses, bú orùm, nke M’nyere ya n’iwu na Horeb inye Israel nile, bú ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche.

5 Le, Mu onwem nēzitere unu Elaija, bú onye-amuma, tutu oké ubọchi ahu di egwu nke Jehova abia.

6 Ọ gēme kwa ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ka obi umu chigharikute kwa ndi bu nna-ha; ka M’we ghara ibia were iwezuga-ka-ebibie-ya tiḅue uwa.