Categories
MAK

MAK 11

1 Mbe ha nābiaru Jerusalem nso, rue Betfagi na Betani nso, n’uzọ ugwu Olive, o we ziga madu abua n’etiti ndi nēso uzọ-Ya,

2 si ha, Jenu n’obodo ntà nke di na ncherita-iru unu: ngwa ngwa mb͕e unu nābà nime ya, unu gāhu nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasighi; tọpunu ya, sekputa ya.

3 Ọ buru kwa na onye ọ bula si unu, Gini mere unu nēme nka? sinu, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà; ngwa ngwa Ọ gēzighachi ya n’ebe a ọzọ.

4 Ha we je, hu nwa-inyinya-ibu elibere n’ọnu-uzọ n’èzí n’amá; ha we tọpu ya.

5 Ufọdu nime ndi guzoro n’ebe ahu we si ha, Ùnu nēme gini, nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu?

6 Ha we gwa ha okwu dika Jisus kwuru: ha we rapu ha.

7 Ha we sekputara Jisus nwa-inyinya-ibu ahu, wukwasi ya uwe-ha; O we nọkwasi ya.

8 Ọtutu madu we tusa uwe-ha n’uzọ; ndi ọzọ akwukwọ osisi, nke ha b͕ubitara n’ubi.

9 Ndi naga n’iru, na ndi nēso, nēti nkpu, si, Hosanna; Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n’aha Onye-nwe-ayi:

10 Ihe agọziri agọzi ka ala-eze bu nke nābia, ala-eze nke nna-ayi Devid: Hosanna n’ebe kachasi ihe nile elu.

11 O we ba Jerusalem, n’ulo uku Chineke; mb͕e O lesiri ihe nile anya buruburu, ebe ọ bu mb͕e anyasi ub͕u a, O we pua je Betani, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu.

12 N’echi-ya, mb͕e ha putara na Betani, agu guru Ya.

13 Mb͕e Ọ huru osisi fig n’ebe di anya nke nwere akwukwọ ndu, Ọ bia, ma ebe ọ di otú a Ọ gāhu ihe n’elu ya: ma mb͕e Ọ biaruru ya aru, Ọ hughi ihe ọ bula ma-ọbughi akwuwọ ndu: n’ihi na ọ bughi oge nkpuru fig.

14 O we za, si ya, Onye ọ bula eri-kwa-la nkpuru ọzọ si n’elu gi puta ebighi-ebi. Ndi nēso uzọ-Ya we nu ya.

15 Ha we bia rue Jerusalem: O we ba n’ulo uku Chineke, malite ichupu ndi nēre na ndi nāzu n’ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nteke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru;

16 O kweghi kwa ka onye ọ bula būru ihe gabiga n’etiti ulo uku Chineke.

17 O we zí ihe, si ha, Èdeghi ya n’akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere mba nile? ma unu onwe-unu emewo ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.

18 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nu ya, ha we nāchọ uzọ ha gēsi la Ya n’iyì: n’ihi na ha nātu egwu Ya, n’ihi na ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n’aru.

19 Mb͕e ọ bula o ruru anyasi Ọ nēsi n’obodo apu.

20 Mb͕e ha nāga n’ututu, ha we hu osisi fig ahu na ọ kpọnwururi site na nkpọrọgwu.

21 Pita we cheta, si Ya, Rabai, le, osisi fig nke I buru ọnu akpọnwuwo.

22 Jisus we za, si ha, Nwenu okwukwe Chineke.

23 N’ezie asim unu, Onye ọ bula nke gāsi ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri; nke nāgaghi-enwe obi abua, kama o kwere na ihe ọ nēkwu nēme; ọ gādiri ya.

24 Ya mere M’ji si unu, Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n’ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu.

25 Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n’elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu.

26 Ma ọ buru na unu onwe-unu ab͕agharaghi, Nna-unu Nke bi n’elu-igwe agaghi-ab͕aghara unu ndahie nile unu.

27 Ha we bia rue Jerusalem ọzọ: mb͕e Ọ nējeghari n’ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye we biakute Ya;

28 ha we si Ya, Ọ̀ bu n’aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye nyere Gi ike a ka I we me ihe ndia?

29 Ma Jisus siri ha, M’gāju unu otù okwu, unu zakwam, emesia M’gāgwa unu aha ike M’ji eme ihe ndia.

30 Baptism nke Jọn, ò sitere n’elu-igwe, ma-ọbu na ò sitere n’aka madu? zanum.

31 Ha we kwurita n’etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n’elu-igwe; Ọ gasi, N’ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya?

32 Ma àyi gāsi kwa, O sitere n’aka madu? ha nātu egwu ndi-Ju: n’ihi na madu nile guru Jọn na ọ bu onye-amuma n’ezie.

33 Ha we za Jisus, si, Ayi amataghi. Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M’ji eme ihe ndia.

Categories
MAK

MAK 12

1 O we malite igwa ha okwu n’ilu. Otù onye kuru ubi-vine, ọ b͕a ya ogige gburugburu, gwu kwa ebe inara manya agāzọchapu na nkpuru-vine, o wu-kwa-ra ulo-elu, were kwa ya tiye n’aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.

2 O we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù n’oge ighọ nkpuru, ka ọ nata n’aka ndi-ọlu-ubi nkpuru ufọdu n’ubi-vine-ya.

3 Ha we jide ya, pia ya ihe, zilaga ya n’aka efu.

4 Ọzọ kwa o we zigara ha orù ọzọ; ha we tiwa isi onye ahu, me ya ihe-ihere.

5 O we ziga onye ọzọ; ha we b͕ue onye ahu: na ọtutu ndi ọzọ; ha nāpia ufọdu ihe, nēb͕u kwa ufọdu.

6 O nwere otù onye fọduru, bú ọkpara ọ huru n’anya: o zigara ya ikpe-azu jekuru ha, si, Ha gāsọpuru ọkparam.

7 Ma ndi-ọlu-ubi ahu siritara onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, ihe-nketa-ya gābu kwa nke ayi.

8 Ha we jide ya, b͕ue ya, tupu ya n’azu ubi-vine ahu.

9 Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme? ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n’iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ.

10 Ùnu agughi ọbuná ihe a edeworo n’akwukwọ nsọ;

Nkume nke ndi nēwu ulo juru,

Nke ahu ka emere isi nkuku ulo:

11 Ọ bu n’aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere,

Ọ bu kwa oké ọlu n’anya-ayi?

12 Ha we chọ uzọ ijide Ya; ma ha turu egwu ìgwè madu ahu; n’ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha; ha we rapu Ya, la.

13 Ha we zigara Ye ufọdu nime ndi-Farisi na ndi Herod, ka ha we nwude Ya n’okwu.

14 Ha we bia, si Ya, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n’ihi na I dighi-ele madu anya n’iru, kama I nēzi uzọ Chineke n’ezi-okwu: ò ziri ezi n’iwu itu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi?

15 Àyi gātu, ma-ọbu na ayi agaghi-atu? Ma ebe Ọ matara iru-abua-ha; Ọ si ha, Gini mere unu nānwam? wetaram otù shilling, ka M’hu ya.

16 Ha we weta ya. Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya? Ha si Ya, Sisa nwe.

17 Jisus we si ha, Nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke. O we ju ha nile anya nke-uku bayere Ya.

18 Ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n’ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya, si,

19 Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, Ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, rapu nwunye n’azu, ma ọ rapughi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.

20 Umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nārapughi nkpuru;

21 nke-abua we kuru ya, nwu kwa, ọ rapughi kwa nkpuru n’azu; nke-atọ otú ahu kwa:

22 ndikom asa ahu arapughi nkpuru. N’ikpe-azu ha nile nwanyi ahu nwu-kwa-ra.

23 Na nbilite-n’ọnwu, nwùnye onye n’etiti ha ka ọ gābu? n’ihi na ha asa nwere ya na nwunye.

24 Jisus siri ha, Ọ̀ bughi n’ihi nka ka unu ji hie uzọ, na unu amataghi ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke?

25 N’ihi na mb͕e ha gēsi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n’ọlulu-di; kama ha di ka ndi-mọ-ozi di n’elu-igwe.

26 Ma n’okwu bayere ndi nwuru anwu, na anēme ka ha si n’ọnwu bilie; ùnu agughi n’akwukwọ Moses, n’ebe edere okwu bayere Osisi ntà, otú Chineke gwara ya, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob?

27 Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: unu onwe-unu nēhie uzọ nke-uku.

28 Otù onye nime ndi-ode-akwukwọ bia-kwa-ra, we nu ka ha nājurita onwe-ha ajuju, ma ebe ọ matara na Ọ zarari ha nke-ọma, ọ jua Ya, si, Òle nke bu nke-mbu n’ihe nile enyere n’iwu?

29 Jisus zara, si, Nke-mbu bu, Nuru, Israel; Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, Onye-nwe-ayi bu otù:

30 i gāhu kwa Onye-nwe-ayi, bú Chineke-gi, n’anya, site n’obi-gi dum, site kwa na nkpuru-obi-gi dum, site kwa n’uche-gi dum, site kwa n’ike-gi dum.

31 Nke-abua bu nke à, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi. Ọ dighi ihe ọzọ enyere n’iwu nke dikariri ndia.

32 Ode-akwukwọ ahu we si Ya, Onye-ozizi, n’ezie I kwuru nke-ọma na Ọ bu otù; ọ dighi kwa chi ọzọ di ma-ọbughi Ya:

33 na ihu Ya n’anya site n’obi-gi dum, site kwa na nghọta-gi dum, site kwa n’ike-gi dum, na ihu onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi, ọ kachasi àjà-nsuresi-ọku nile na àjà ọzọ nile nke-uku.

34 Mb͕e Jisus huru na ọ zara dika onye nwere uche, Ọ si ya, I nọghi ebe di anya n’ala-eze Chineke. Ma ọ dighi onye nwere anya-ike site na mb͕e ahu iju Ya ajuju.

35 Jisus we za, mb͕e Ọ nēzi ihe n’ulo uku Chineke, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid?

36 Devid onwe-ya siri nime Mọ Nsọ,

Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,

Nọdu ala n’aka-nrim,

Rue mb͕e M’gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.

37 Devid onwe-ya nākpọ Ya Onye-nwe-ya; òle ebe O si buru kwa Nwa-ya? Oké ìgwè madu ahu we were obi-utọ nu okwu-Ya.

38 N’ozizi-Ya Ọ si kwa, Lezienu anya ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n’uwe-nwuda, na inara ekele n’ọma-ahia nile unu,

39 na isi oche nile n’ulo-nzukọ-unu, na isi ọnọdu nile n’oriri nile unu:

40 ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya; ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara ókè kari ndi ọzọ.

41 O we nọdu n’ulo uku Chineke na ncherita-iru ebe anēdebe ùtú anātu, O we nēle otú ìgwè madu nātubà ego n’ebe ùtú ahu: ọtutu ndi bu ọgaranya nātubà kwa ri nne.

42 Otù nwayi, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, we bia, tubà ego ntà abua, nke mere otù farthing.

43 O we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si ha, N’ezie asim unu, Nwanyi a, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, ọ tubàra kari ndi nile nātubà nime ebe ùtú ahu:

44 n’ihi na ha nile sitere n’inwebiga-àkù-ókè-ha tubà; ma nwanyi ahu sitere n’ukọ-ya tubà ka ihe nile nke o nwere ra, bú ihe dum o ji biri.

Categories
MAK

MAK 13

1 Mb͕e Ọ nāputa n’ulo uku Chineke, otù onye n’etiti ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Onye-ozizí, le aha nkume na aha owuwu-ulo ndia bu!

2 Jisus we si Ya, Ì huru oké owuwu-ulo ndia? Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n’ebe a n’elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n’ala.

3 Mb͕e Ọ nānọdu n’elu ugwu Olive na ncherita-iru ulo uku Chineke, Pita na Jemes na Jọn na Andru we jua Ya iche, si,

4 Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama mb͕e ọ bula agaje imezu ihe ndia nile?

5 Ma Jisus malitere isi ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu.

6 Ọtutu madu gābia n’aham, si, Mu onwem bu Ya; ha gēduhie kwa ọtutu madu.

7 Ma mb͕e ọ bula unu gānu okwu agha di iche iche na akukọ agha di iche iche, unu atula ujọ: ihe ndia aghaghi iputa; ma ọgwugwu ihe nile akērughi.

8 N’ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: ala-ọma-jijiji gādi n’ebe di iche iche; oké unwu di iche iche gādi: ihe ndia bu nmalite ihe-nb͕u.

9 Ma unu onwe-unu lezie anya n’onwe-unu: n’ihi na ha gārara unu nye n’aka nnọkọ-ikpé di iche iche; n’ulo-nzukọ di iche iche ka agāpia kwa unu ihe; n’iru ndi-isi na ndi-eze ka unu gēguzo kwa n’ihim, iburu ha àmà.

10 Aghaghi kwa ibu uzọ kwusa ozi ọma nkem n’iru mba nile.

11 Ma mb͕e ọ bula ha duru unu je ikpé, rara kwa unu nye, unu ebula uzọ nēcheb͕u onwe-unu okwu unu gēkwu: kama okwu ọ bula agēnye unu n’oge hour ahu, kwuenu nke ahu: n’ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ Nsọ.

12 Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n’aka ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye; umu gēbili kwa imegide ndi muru ha, me kwa ka ha nwua ọnwu.

13 Madu nile gākpọ kwa unu asì n’ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agazọputa.

14 Ma mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ n’efu, ka ọ nēguzo n’ebe ọ nēkwesighi (onye nāgu, ya tugharia uche), mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n’ugwu:

15 onye nọ kwa n’elu ulo, ya ghara iridata, ma-ọbu ibà nime, ikwapu ihe ọ bula n’ulo-ya:

16 onye nọ kwa n’ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe-ya.

17 Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.

18 Ma kpenu ekpere ka ọ ghara idi na mb͕e oyi.

19 N’ihi na mb͕e ahu gābu nkpab͕u, nke aha nkpab͕u di otú a akādighi site na nmalite òkìkè-uwa nke Chineke kère rue mb͕e a, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.

20 Ọ buru kwa na Onye-nwe-ayi emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n’ihi ndi arọputara, ndi Ọ rọputara, O mere ka ubọchi ahu di nkpirikpi.

21 Mb͕e ahu ọ buru na onye ọ bula gāsi unu, Le, Kraist nọ n’ebe a; ma-ọbu, Le, n’ebe ahu; unu ekwela:

22 n’ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche, ka ha we duhie ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.

23 Ma unu onwe-unu lezie anya: le, agwawom unu ihe nile mb͕e akēmeghi ha.

24 Ma na mb͕e ahu, mb͕e nkpab͕u ahu gasiri, anyanwu gāb͕a ọchichiri, ọnwa agaghi-enye kwa ihè-ya,

25 kpakpando nile ganāda kwa site n’elu-igwe, agēme kwa ka ike nile nke di n’elu-igwe me nkpatu.

26 Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n’igwe-oji nile n’oké ike na ebube.

27 Mb͕e ahu Ọ gēzipu kwa ndi-mọ-ozi-Ya, me ka ndi nke Ya arọputara si n’ifufe anọ zukọ, site na nsọtu uwa rue nsọtu elu-igwe.

28 Ma site n’aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso;

29 otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia ka ha nāputa, maranu na Ọ nọ nso, n’ọnu-uzo.

30 N’ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme.

31 Elu-igwe na uwa gagabiga: ma okuwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.

32 Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amat’aghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara.

33 Lezienu anya, murunu anya, nēkpe-kwa-nu ekpere: n’ihi na unu amataghi mb͕e oge ahu bu.

34 Ọ di ka mb͕e madu, onye jere inọdu n’ala ndi ọzọ, ebe ọ rapuru ulo-ya, nye kwa ndi-orù-ya ọlu ichi-isi, nye onye ọ bula nime ha ọlu-ya, o nye-kwa-ra onye-ọnu-uzọ iwu ka ọ che nche.

35 Ya mere, nēchenu nche: n’ihi na unu amataghi mb͕e Onye-nwe ulo gābia, ma ọ bu n’anyasi, ma-ọbu n’etiti abali, ma-ọbu mb͕e oke-ọkuku kwara, ma-ọbu n’ututu;

36 ka O we ghara ihu unu ka unu nāraru ura, ma ọ buru na Ọ bia na mberede.

37 Ma okwu M’nāgwa unu ka M’nāgwa madu nile, Nēchenu nche.

Categories
MAK

MAK 14

1 Ma ememe ngabiga na achicha ekoghi-eko gādi mb͕e ubọchi abua gasiri: ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi jide Ya n’aghughọ, b͕ue Ya:

2 n’ihi na ha nāsi, Ọ bughi n’ememe a, ka ùzù ndi-Ju we ghara idi ma eleghi anya.

3 Mb͕e Ọ nọ na Betani n’ulo Saimon onye-ekpenta, mb͕e Ọ nānọdu na nri, otù nwanyi we bia nke nēji ite alabaster, nke manu-otite ezi nard di oké ọnu-ahia nke-uku di ya; ọ kuwara ite ahu, we wusa manu-otite ahu n’isi-ya.

4 Ma ufọdu di ndi iwe nēwe nke-uku n’etiti ha, ha si, Àlawo manu-otite a n’iyì otú a iji me gini?

5 N’ihi na apuru ire manu-otite a kari ọgu shilling iri-na-ise, we nye ndi-ob͕enye. Ha we tamu ntamu megide nwanyi ahu.

6 Ma Jisus siri, Rapunu ya; gini mere unu nēsob͕u ya? ọ luru ọlu ọma n’arum.

7 N’ihi na unu nwere ndi-ob͕enye n’etiti unu mb͕e nile, mb͕e ọ bula unu chọrọ unu puru ime kwa ha ihe ọma: ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.

8 O mere ihe ọ nwere ike ime: o buru uzọ te arum manu-otite ka ewe doziem n’olìlì.

9 Ma n’ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n’uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya.

10 Judas Iskariot, onye nke bu otù nime ndi-ozi iri na abua ahu, we jekuru ndi-isi-nchu-àjà, ka o we rara Ya nye n’aka-ha.

11 Ma mb͕e ha nuru ya ha ṅuria ọṅu, we kwe nkwa inye ya ego. Ọ we nāchọ oghere o gēsi rara Ya nye.

12 N’ubọchi mbu nke achicha ekoghi-eko, mb͕e ha nāchu aja ngabiga, ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe I nāchọ ka ayi je dozie ka I we rie oriri ngabiga?

13 O we zipu madu abua n’etiti ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Jenu n’obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute kwa unu: sonu ya;

14 ebe ọ bula ọ gābà kwa, sinu nna-nwe ulo, Onye-ozizí si, Òle ebe ulo-ọbìa edeberem di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga?

15 Ya onwe-ya gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n’elu ulo akwadebeworo dozi kwa: n’ebe ahu dozienu ihe nye ayi.

16 Ndi ahu nēso uzọ-Ya we pua ba n’obodo, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga.

17 Mb͕e o ruru anyasi Ya na ndi-ozi iri na abua ahu we bia.

18 Mb͕e ha nānọdu na nri nēri kwa ihe, Jisus we si, N’ezie asim unu, Otù onye si n’etiti unu puta gāraram nye, bú onye Mu na ya nēri ihe.

19 Ọ malitere iwuta ha, ha malite-kwa-ra isi Ya n’otù, Ọ̀ bu mu?

20 Ma Ọ siri ha, Ọ bu otù onye nime unu iri na abua, onye nke Mu na ya nēsukọ nri n’afere.

21 N’ihi na Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ banyere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n’aka-ya rara Nwa nke madu nye Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.

22 Mb͕e ha nēri ihe, O we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, nye ha, si, Naranu: nka bu arum.

23 O we nara iko, kele kwa, we nye ha: ha nile we ṅua nime ya.

24 O we si ha, Nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusì n’ihi ọtutu madu.

25 N’ezie asim unu, M’gaghi-aṅu kwa ma-ọli n’ihe si n’osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e M’gāṅu ya ọhu n’ala-eze Chineke.

26 Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.

27 Jisus we si ha, Agēme ka unu nile ma n’ọnyà: n’ihi na edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si, M’gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu-Ya.

28 Ma mb͕e emere ka M’si n’ọnwu bilie, M’gēburu unu uzọ ga Galili.

29 Ma Pita siri Ya, Ọ buru na agēme ọbuná madu nile ka ha ma n’ọnyà, ma agaghi-eme mu onwem.

30 Jisus we si ya, N’ezie asim gi, na ta, bú n’abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá ub͕ò abua, i gāgọnaririn ub͕ò atọ.

31 Ma ọ nēkwusi ike nke-uku, si, Ọ buru na ọ di nkpà ka m’so Gi nwua, m’gaghi-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ha nile kwuru.

32 Ha we biarue ogige nke aha-ya bu Getsemane: O we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n’ebe a, rue mb͕e M’nēkpe ekpere.

33 O we kuru Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, ibobo we malite inwu Ya n’aru nke-uku, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri.

34 O we si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n’ebe a, nēche-kwa-nu nche.

35 O we ga n’iru nke-ntà, da n’ala, we kpe ekpere ka oge hour ahu we gabiga Ya, ma ọ buru na ọ gēkwe me.

36 O we si, Aba, Nna, I puru ime ihe nile; naram iko a: ma ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Gi onwe-gi nāchọ.

37 O we bia, hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Saimon, ì nāraru ura? ì nweghi ike iche nche otù oge hour?

38 Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n’ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n’ezie, ma anu-aru adighi ike.

39 O we rapu ha je kwa ọzọ, kpe ekpere, nēkwu otù okwu ahu.

40 O we bia kwa ọzọ, hu ha ka ha nāraru ura, n’ihi na anya-ha di oké arọ́; ha amataghi kwa ihe ha gāza Ya.

41 O we bia ọbibia nke-atọ, si ha, Nārarunu ura site n’ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: o zuwo: oge hour nkem eruwo; le, anārara Nwa nke madu nye n’aka ndi-nmehie.

42 Bilienu, ka ayi je: le, onye nāraram nye nọ nso.

43 Ngwa ngwa, mb͕e Ọ kpu okwu n’ọnu, Judas, otù onye n’etiti ndi-ozi iri na abua ahu, biara, ya na ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n’ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nọ.

44 Ma onye nārara Ya nye nyere ha-ri ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m’gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya; jidenu Ya, lezienu anya duru Ya je.

45 Mb͕e ọ biara, ngwa ngwa ọ biakutere Ya, si, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku.

46 Ha we tukwasi Ya aka, jide Ya.

47 Ma otù onye n’etiti ndi guzoro nso miputara mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti-ya.

48 Jisus we za, si ha, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe?

49 Kwa-ubọchi Mu na unu nọ n’ulo uku Chineke ebe M’nēzí ihe, ma unu ejideghm: ma emere nka ka ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ we mezu.

50 Ha nile we rapu Ya, b͕alaga.

51 Ma otù okorọbia sonyere Ya, onye b͕okwasiri ezi ákwà ọcha n’aru ọtọ ya: ha we jide ya:

52 ma ọ rapuru ezi ákwà ọcha ahu, b͕ara ọtọ, b͕alaga.

53 Ha we si n’ebe ahu duru Jisus jekuru onye-isi-nchu-àjà: ha nile, bú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, we b͕akọ n’ebe ọ nọ.

54 Pita soro kwa Ya-ri n’ebe di anya, rue nime ulo, nime obí onye-isi-nchu-àjà; ọ nānọdu kwa n’etiti ndi nēje ozi, ọ nānya ọku n’ihè ọku.

55 Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà imegide Jisus ime ka Ọ nwua; ma ha achọtaghi.

56 N’ihi na ọtutu madu nāb͕a àmà ugha imegide Ya, àmà-ha abughi kwa otù.

57 Ufọdu we bilie, b͕a àmà ugha megide Ya, si,

58 Ayi onwe-ayi nuru ka Ọ nāsi, Mu onwem gākwatu ulo nsọ a nke ejiri aka me, n’ubọchi atọ M’gēwu kwa ulo ọzọ nke anējighi aka me.

59 Ọbuná otú a àmà-ha abughi kwa otù.

60 Onye-isi-nchu-àjà we bilie n’etiti, jua Jisus, si, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi?

61 Ma O kpuchiri ọnu, ọ dighi kwa ihe ọ bula Ọ zara. Onye-isi-nchu-àjà juba-kwa-ra Ya ọzọ, si Ya, Gì onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara nke Onye ahu agọziri agọzi?

62 Jisus we si, Mu onwem bu Ya: unu gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n’aka-nri nke ike, nābia kwa, Ya na igwe-oji nile nke elu-igwe.

63 Onye-isi-nchu-àjà we dọwa uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ?

64 Unu nuru nkwulu ahu: gini bu uche-unu? Ha nile we ma Ya ikpé, si na O kwesiri inwu ọnwu.

65 Ufọdu we malite ibusa Ya ọnu-miri, na ikechi iru-Ya, na iti Ya aka, na isi Ya, Bu amuma: ndi nēje ozi we nara Ya n’ipia Ya ihe.

66 Mb͕e Pita nọ n’okpuru n’obí, otù nime umu-ab͕oghọ ndi nējere onye-isi-nchu-àjà ozi we bia:

67 mb͕e ọ huru Pita ka ọ nānya ọku, o we le ya anya, si, Gi onwe-gi na Onye Nazaret ahu, bú Jisus, nọ-kwa-ra.

68 Ma ọ gọrọ, si, Amataghm, aghọtaghm kwa ihe gi onwe-gi nēkwu: o we pua je n’uzọ-nbata.

69 Nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, malite kwa ọzọ isi ndi guzoro nso, Nwoke a bu otù onye nime ha.

70 Ma ọ gọ-kwa-ra ọzọ. Mb͕e nwa oge gasiri ndi guzoro nso we si kwa Pita ọzọ, N’ezie i bu otù onye nime ha; n’ihi na i bu kwa onye Galili.

71 Ma ọ malitere idu ikwù, na iṅu iyí, si, Amataghm Nwoke a Onye unu nēkwu.

72 Ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa ákwá nke ub͕ò abua. Pita we cheta okwu ahu, otú Jisus siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ub͕ò abua, i gāgọnarim ub͕ò atọ. Mb͕e ọ tulere okwu a n’obì o we kwa ákwá.

Categories
MAK

MAK 15

1 Ngwa ngwa n’ututu ndi-isi-nchu-àjà, ha na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, na nnọkọ-ikpé dum, b͕ara ìzù, we ke Jisus ab͕u, kupu Ya je, rara Ya nye n’aka Pailat.

2 Pailat we jua Ya, si, Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju? O we za ya, si, Gi onwe-gi kwuru.

3 Ndi-isi-nchu-àjà we nēbo Ya ọtutu ebubo.

4 Pailat we ju kwa Ya ọzọ, si, Ì zaghi ihe ọ bula? le ka ọtutu ihe ha nēbo Gi ra.

5 Ma Jisus azaghi ihe ọ bula ọzọ; ya mere na o juru Pailat anya.

6 Ma n’ememe ọ nārapuru ha otù onye-nkpọrọ, onye ha nāriọ n’aka-ya.

7 Ma otù onye di anākpọ Barabas, onye ekereri ab͕u, ya na ndi biliri imegide ndi-isi, madu ndi b͕u-kwa-ra madu na nbili ahu.

8 Ìgwè madu ahu we rigo, malite iriọ ya ka o me dika ọ nēmere ha.

9 Pailat we za ha, si, Ùnu nāchọ ka m’rapuru unu Eze ndi-Ju?

10 N’ihi na ọ mara na ndi-isi-nchu-àjà rara Ya-ri nye n’ihi ekworo.

11 Ma ndi-isi-nchua-àjà kwaliri ìgwè madu ahu, ka ọ rapuru-ha Barabas kari Jisus.

12 Ma Pailat za kwa-ra ọzọ, si ha, Ọ̀ bu gini ka m’gēme kwa Onye ahu unu nākpọ Eze ndi-Ju?

13 Ma ha ti-kwa-ra nkpu ọzọ, si, Kpọgide Ya n’obe.

14 Pailat we si ha, É-è, n’ihi na Ò mere ihe ọjọ gini? Ma ha tibigara nkpu ókè, si, Kpọgide Ya n’obe.

15 Ma Pailat, ebe ọ nēzube ime ihe gātọ ìgwè madu ahu utọ n’obi, ọ rapuru ha Barabas, o we rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n’obe.

16 Ndi-agha we dupu Ya ga ba n’obí, nke bu Pritoriọm; ha we kpọkọ òtù- ha dum.

17 Ha we yikwasi Ya uwe ododo; mb͕e ha kpasiri okpu-nmeri nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n’isi;

18 ha we malite ikele Ya, si, Ekele, Eze ndi-Ju!

19 Ha were kwa amì nēti Ya n’isi, ha nābusa kwa Ya ọnu-miri, ha we b͕ue ikperè nākpọ isi ala nye Ya.

20 Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ododo ahu, we yikwasi Ya uwe-Ya nile. Ha we dupu Ya ka ha kpọgide Ya n’obe.

21 Ha we jide otù onye nke nāgabiga ka o so ha, ka o we būru obe-Ya, bú Saimon onye Sairini, nna Aleksanda na Rufọs, nke si n’azu obodo ahu bia.

22 Ha we kuru Ya bia n’ebe anākpọ Gọlgọta, nke bu, ma asugharia ya, Ebe okpokoro-isi.

23 Ha we che n’iru Ya manya-vine nke agwara myrrh: ma Ọ naraghi ya.

24 Ha we kpọgide Ya n’obe, kè kwa uwe-Ya n’etiti ha, nēfe nzà n’elu ha, nke onye ọ bula gēwe.

25 Ma ọ bu oge hour nke-atọ, ha we kpọgide Ya n’obe.

26 Edekwasi-kwa-ra ndekwasi nke ihe eboro Ya, EZE NDI-JU.

27 Ha kpọgide-kwa-ra ndikom abua tinyere Ya ndi nāpunara madu ihe; otù onye n’aka-nri-Ya, na otù onye n’aka-ekpe-Ya.

28 Ewe mezue ihe edere n’akwukwọ nsọ, nke si, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya.

29 Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, nāsi kwa, Ehe! Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n’ubọchi atọ,

30 zọputa Onwe-gi, si n’elu obe ridata.

31 Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ nēme Ya ihe-ọchì n’etiti onwe-ha, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya.

32 Ka Kraist, Eze Israel, si n’elu obe ridata ub͕u a, ka ayi we hu kwere kwa. Ndi akpọgidere Ya na ha n’obe nāta kwa Ya uta.

33 Mb͕e o ruru oge hour nke-isi, ọchichiri we b͕a n’ala ahu dum rue oge hour nke-iteghete.

34 N’oge hour nke-iteghete Jisus we were oké olu tie nkpu, si, Eloi, Eloi, lama sabaktani? nke bu, ma asugharia ya, Chinekem, Chinekem, gini mere I ji rapu nání Mu?

35 Ufọdu n’etiti ndi guzoro nso, mb͕e ha nuru ya, ha we si, Le, Ọ nākpọ Elaija

36 Otù onye we b͕a ọsọ, were manya-vine b͕ara uka b͕aju sponge, tukwasi ya n’amì, nye Ya ka Ọ ṅua, si, Rapunu; ka ayi hu ma Elaija nābia iwedata Ya n’obe.

37 Ma Jisus mere ka olu-Ya dasie ike, O we kubìe ume.

38 Ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa iberibe abua site n’elu rue ala.

39 Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nke guzoro nso na ncherita-iru Ya, huru na O kubìri ume otú a, ọ si, N’ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke.

40 Ndinyom di kwa ndi nọ n’ebe di anya nēkiri: n’etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes nke-ntà na Joses, na Salomi, nọ;

41 ndi nēso Ya mb͕e Ọ nọ na Galili, nēje-kwa-ra Ya ozi; na ọtutu ndinyom ọzọ ndi soro Ya rigoro Jerusalem.

42 Mb͕e o ruru anyasi ub͕u a, ebe ọ bu Nkwadebe, nke bu ubọchi buru ubọchi-izu-ike uzọ,

43 Josef nke Arimatia we bia, onye bu onye-nnọkọ-ikpé onye anāsọpuru, onye ya onwe-ya nēche kwa ala-eze Chineke; o were anya-ike bakuru Pailat, riọ aru Jisus.

44 O we ju Pailat anya ma ọ buru na Ọ nwuruwori: o we kpọ ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise biakute ya, ọ jua ya ma ọ di anya mb͕e Ọ nwuru.

45 Mb͕e ọ matara site n’ọnu ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, o we rara ozu Jisus nye Josef n’efu.

46 O we zuta ezi ákwà ọcha; mb͕e o budatasiri Ya, o we ke Ya n’ezi ákwà ọcha ahu, tọb͕ọ Ya n’ílì nke egwuwarari n’oké nkume; o we kpọre otù nkume kwachie ọnu-uzọ ílì ahu.

47 Ma Meri Magdalini na Meri nne Joses huru ebe atọb͕ọrọ Ya.

Categories
MAK

MAK 16

1 Mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri, Meri Magdalini, na Meri nne James, na Salomi, we zuta uda utọ di iche iche, ka ha we bia te Ya manu.

2 N’isi-ututu n’ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, ha we bia rue ílì-Ya mb͕e anyanwu wara.

3 Ha we sirita onwe-ha, Ònye gākpọrepuru ayi nkume ahu n’ọnu-uzọ ílì?

4 Mb͕e ha lere anya n’elu, ha we hu na akpọreghachiwo nkume ahu: n’ihi na o riri nne nke-uku.

5 Ha we ba n’ílì, hu nwa-okorọbia ka ọ nọduru n’aka-nri, b͕okwasi kwa uwe-nwuda ọcha; ibobo we nwua ha n’aru nke-uku.

6 Ma ọ si ha, Ka ibobo ghara inwu unu n’aru nke-uku: unu nāchọ Jisus, Onye Nazaret, Onye akpọgideworo n’obe: emere ka O si n’ọnwu bilie; Ọ nọghi n’ebe a: le, ebe ha tọb͕ọrọ Ya!

7 Kama labanu, si ndi nēso uzọ-Ya na Pita, O buru unu uzọ ga Galili: n’ebe ahu ka unu gāhu Ya, dika Ọ gwara unu.

8 Ha we pua, si n’ílì ahu b͕alaga; n’ihi na ọma-jijiji na njubiga-anya-ókè nānwu ha n’aru: ha agwaghi kwa onye ọ bula ihe ọ bula; n’ihi na ha nātu egwu.

9 Ma mb͕e O siri n’ọnwu bilie n’ututu n’ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, O buru uzọ were Onwe-ya gosi Meri Magdalini, onye Ọ chupururi mọ ọjọ asa nime ya.

10 Nwanyi ahu we ga kọrọ ndi Ya na ha nọri, mb͕e ha nēru újú nākwa kwa ákwá.

11 Ma mb͕e ndi ahu nuru na Ọ di ndu, na ya onwe-ya hu-kwa-ra Ya-ri, ha ekweghi.

12 Ma mb͕e ihe ndia gasiri emere ka Ọ puta ìhè nye madu abua nime ha n’udi di iche, mb͕e ha nēje ije, nāga n’azu obodo.

13 Ndi ahu we je kọrọ ndi fọduru: ha ekweghi kwa okwu-ha.

14 Emesia emere ka Ọ puta ìhè nye ndi-ozi iri na otù onwe-ha mb͕e ha nọduru na nri; O we ta ekweghi-ekwe-ha na obi-etili-ha uta, n’ihi na ha ekweghi okwu ndi huru Ya mb͕e emesiri ka O si n’ọnwu bilie.

15 O we si ha, Ganu n’uwa nile, kwusara ihe nile ekère èkè ozi ọma nkem.

16 Onye nke kwere, nke eme-kwa-ra ya baptism, agāzọputa ya; ma agāma onye nke nēkweghi ikpé.

17 Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n’aham ka ha gāchupu ndi-mọ ọjọ; ha gēkwu okwu n’asusu ọhu di iche iche;

18 ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha aṅua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gaghi emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike.

19 Ya mere, otú a, mb͕e Ọ gwasiri ha okwu, ewe kuru Onye-nwe-ayi Jisus rigo n’elu-igwe, O we nọdu n’aka-nri nke Chineke.

20 Ndi ahu we pua, kwusa ebe nile, Onye-nwe-ayi nēso kwa ha n’ilu ọlu, nēme okwu-ha ka o guzosie ike site n’ihe-iriba-ama di iche iche nke nēso. Amen.