Categories
MAK

MAK 1

1 Nmalite ozi ọma jisus Kraist, Ọkpara Chineke.

2 Dika edeworo ya n’akwukwọ Aisaia onye-amuma, si,

Le, Mu onwem nēzipu onye-ozim ka ọ ga n’iru gi,

Onye gēmezi uzọ-gi;

3 Olu otù onye nēti nkpu n’ọhia, si,

Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi,

Me okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie;

4 Jọn putara ìhè, onye nēme baptism n’ọhia, nēkwusa kwa baptism nchèghari inwe nb͕aghara nmehie.

5 Ala Judia nile na ndi Jerusalem nile nāpukuru ya; ọ neme kwa ha baptism n’osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha.

6 Jọn nēyi aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n’úkwù-ya, nēri kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia.

7 Ọ nēkwusa kwa, si, Onye kam ike nābia n’azum, Onye m’nērughi iruru ala itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya abua.

8 Mu onwem jiri miri me unu baptism; ma Onye ahu geji Mọ Nsọ me unu baptism.

9 O rue na mb͕e ahu, Jisus siri na Nazaret nke Galili bia, Jọn we mee Ya baptism nime Jọdan.

10 Ngwa ngwa mb͕e O si na miri nārigo, Ọ huru elu-igwe ka ha nādọwa, Ọ hu-kwa-ra Mọ Nsọ dika nduru ka Ọ nēfedakwasi Ya:

11 olu we si n’elu-igwe ahu da, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M’huru n’anya, ihe-Gi dim ezi nma.

12 Ngwa ngwa Mọ Nsọ we chua Ya ba n’ọhia.

13 O we nọ n’ọhia ọgu ubọchi abua, Setan nānwa Ya; Ya na anu ọhia nile nọ kwa; ndi-mọ-ozi nēje-kwa-ra Ya ozi.

14 Ma mb͕e arasiiri Jọn nye, Jisus biara na Galili, nēkwusa ozi ọma Chineke,

15 si, Oge ezuwo, ala-eze Chineke di kwa nso: chègharianu, kwe-kwa-nu n’ozi ọma.

16 Mb͕e Ọ nāga n’usọ oké osimiri Galili, O we hu Saimon na Andru nwa-nne Saimon ka ha nāwuye úb͕ú n’oké osimiri: n’ihi na ha bu ndi-ọkù.

17 Jisus we si ha, Bianu som n’azu, M’gēme kwa ka unu buru ndi-ọkù nākuta madu.

18 Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya.

19 Mb͕e Ọ gara n’iru nke-ntà, O we hu Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, ndi nọ kwa n’ub͕ọ, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù.

20 Ngwa ngwa O we kpọ ha: ha we rapu nna-ha Zebedi n’ub͕o, ya na ndi-ọlu egoro ego, ha je so Ya n’azu.

21 Ha we ga ba na Kapanaum; ngwa ngwa O we ba n’ulo-nzukọ-ha n’ubọchi-izu-ike we nēzí ihe.

22 Ibobo ozizí-Ya we nwua ha n’aru: n’ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike, ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ.

23 Ngwa ngwa nwoke nke di n’aka mọ nādighi ọcha we nọ n’ulo-nzukọ-ha; o we tisie nkpu ike,

24 si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n’iyì? Amataram gi Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke.

25 Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta.

26 Mọ ahu nādighi ọcha we se ya, were kwa oké olu kpọ nkpu, we si nime ya puta.

27 Ibobo we nwua ha nile n’aru, nke mere ka ha jurita onwe-ha, si, Gini bu nka? ozizí ọhu! ọ bu n’ike ka Ọ nēnye ọbuná ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha nāṅa kwa Ya nti.

28 Ngwa ngwa ewe kọsa akukọ-Ya ebe nile n’ala dum di Galili gburugburu.

29 Ngwa ngwa, mb͕e ha putasiri n’ulo-nzukọ ahu, ha we ba n’ulo Saimon na Andru, ha na Jemes na Jọn.

30 Ma nne nwunye Saimon nēdina n’aru-ọku; ngwa ngwa ha we gwa Ya okwu bayere nwanyi ahu:

31 O we jekuru ya, jide ya n’aka, palie ya; aru-ọku ahu we rapu ya, ọ nējere ha ozi.

32 Ma mb͕e o ruru anyasi, mb͕e anyanwu dara, ha nēkutara Ya ndi aru nādighi nma, na ndi mọ ọjọ ji

33 Obodo ahu dum we zukọ n’ọnu-uzọ.

34 O we me ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi aru nādighi nma n’ọria di iche iche, Ọ chupu kwa ọtutu ndi-mọ ọjọ; O kweghi kwa ndi-mọ ọjọ kwue okwu, n’ihi na ha matara Ya.

35 O we bilie n’isi-ututu, n’ezi abali, pua, je n’ebe bu ọhia, nọ nēkpe ekpere n’ebe ahu.

36 Saimon na ndi ya na ha nọ we b͕aso Ya;

37 ha we chọta Ya, si Ya, Madu nile nāchọ Gi.

38 O we si ha, Ka ayi ga ebe ọzọ n’obodo nile so nka, ka M’kwusa kwa n’ebe ahu; n’ihi na ọ bu ime nka ka M’putara.

39 O we ba n’ulo-nzukọ nile ha gazue na Galili dum, nēkwusa ozi ọma nāchupu kwa ndi-mọ ọjọ.

40 Onye-ekpenta we biakute Ya, nāriọ Ya, nēb͕u-kwa-ra Ya ikperè, nāsi kwa Ya, Ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m’di ocha.

41 O we nwe ọmiko, setipu aka-Ya, metu ya, si ya, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha.

42 Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya, eme kwa ka ọ di ọcha.

43 O we dọ ya aka na nti nke-uku, we chupu ya ngwa ngwa,

44 si ya, Lezi anya ka i ghara igwa onye ọ bula okwu ọ bula: ma laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n’iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha nke Moses nyere n’iwu, ka ọ buru ha àmà.

45 Ma ọ puru, malite ikwusazu ya, na ifesa okwu ahu, nke mere na O nweghi ike ọzọ ibà nime obodo n’iru ọra, kama Ọ nọ n’azu obodo n’ebe bu ọhia: ha we si n’ebe nile nābiakute Ya.

Categories
MAK

MAK 2

1 Mb͕e Ọ batara ọzọ na Kapanaum mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, ewe nu na Ọ nọ nime ulo.

2 Otutu madu we zukọ, nke mere na uzọ adighi ọzọ, é-è, ọbuná n’ọnu-uzọ: Ọ nāgwa kwa ha okwu Chineke.

3 Ha we bia, kutara Ya otù onye akuku-aru-ya nwuru anwu, nke madu anọ nēbu.

4 Mb͕e ha apughi ikuru ya biakute Ya n’ihi ìgwè madu, ha we kpupu elu ulo ebe Ọ nọ: mb͕e ha gwupusiri ya, ha we buda ute nke onye akuku-aru-ya nwuru anwu nēdina.

5 Mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, anāb͕aghara gi nmehie-gi nile.

6 Ma ufọdu n’etiti ndi-ode-akwukwọ nānọdu ala n’ebe ahu, nātule kwa okwu n’obi-ha,

7 si, Gini mere Nwoke a nēkwu okwu otú a? Ọ nēkwulu Chineke: ònye puru ib͕aghara nmehie, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke?

8 Ngwa ngwa ebe Jisus mazuru nime mọ-Ya na ha nātule okwu nime onwe-ha otú a, Ọ si ha, Gini mere unu nātule ihe ndia n’obi-unu?

9 Òle nke ka nfe, isi onye akuku-aru-ya nwuru anwu, Anāb͕aghara gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, chiri ute-gi, jeghari kwa?

10 Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n’elu uwa ib͕aghara nmehie, (Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu),

11 M’si gi, Bilie, chiri ute-gi, la n’ulo-gi.

12 O we bilie, chiri ute-ya ngwa ngwa, pua n’iru ha nile; nke mere ka ibobo nwua ha nile n’aru, ha we to Chineke, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula ayi huru ya otú a.

13 O we pua ọzọ ga n’usọ oké osimiri; ìgwè madu ahu nile we nābiakute Ya, Ọ nēzí kwa ha ihe.

14 Mb͕e Ọ nāga, Ọ hu Livai nwa Alfiọs, ka ọ nọduru n’ulọ-ùtú, Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya

15 O rue, na Ọ nọduru na nri n’ulo-ya, ọtutu ndi ọna-utu na ndi-nmehie so-kwa-ra Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri: n’ihi na ha di ọtutu, ha nēso kwa Ya.

16 Mb͕e ndi-ode-akwukwọ di n’etiti ndi-Farisi huru na O nēso ndi-nmehie na ndi-ọna-utu ahu eri ihe, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, Gini mere Ọ nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ahu eri ihe?

17 Mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma: abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie.

18 Ndi nēso uzọ Jọn na ndi-Farisi nēbu kwa ọnu: ha we bia, si Ya, N’ìhi gini ka ndi nēso uzọ Jọn na ndi nēso uzọ ndi-Farisi nebu ọnu, ma ndi nēso uzọ-Gi adighi-ebu ọnu?

19 Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru ibū ọnu mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ka oge ra ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ ha apughi ibū ọnu.

20 Ma ubọchi gābia, mb͕e agānapu ha Onye nālu nwunye ohu, mb͕e ahu ka ha gēbu kwa ọnu n’ubọchi ahu.

21 Ọ dighi onye ọ bula nēwere iberibe ákwà ọb͕ub͕a ọhu dukọta n’uwe ochie: eme otú a, nke kwesiri imechi ya nādọkapu ihe n’aru-ya, nke-ọhu nādọkapu n’aru nke-ochie, ndọka jọkariri njọ aputa.

22 Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, manya-vine gāb͕awa karama-akpukpọ ahu, manya-vine na karama-akpukpọ ala kwa n’iyì: ma anāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu.

23 O rue, na Ọ nāga n’etiti ubi ọka n’ubọchi-izu-ike; ndi nēso uzọ-Ya we malite ighọ oko ọka mb͕e ha nāga.

24 Ndi-Farisi we si Ya, Le, gini mere ha nēme n’ubọchi-izu-ike ihe nēzighi ezi n’iwu?

25 O we si ha, Ọ dighi mb͕e ọ bula unu guru ihe Devid mere, mb͕e ọ nọ na nkpà, mb͕e agu gu-kwa-ra ya, ya onwe-ya, na ndi soro ya?

26 Otú ọ batara n’ulo Chineke mb͕e Abaiata bu onye-isi-nchu-àjà, rie ob͕e achicha anēche n’iru Chineke, nke nēzighi ezi n’iwu ka erie, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ?

27 O we si ha, Emere ubọchi-izu-ike n’ihi madu, emeghi madu n’ihi ubọchi-izu-ike:

28 ya mere Nwa nke madu ji buru kwa Onye-nwe ubọchi-izu-ike.

Categories
MAK

MAK 3

1 I bà-kwa-ra ọzọ n’ulo-nzukọ-ha; otù nwoke nọ kwa n’ebe ahu nke aka-ya kpọnwuru akpọnwu.

2 Ha we nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n’ubọchi-izu-ike; ka ha we bo Ya ebubo.

3 O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, puta n’etiti.

4 O we si ha, Ò ziri ezi n’iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n’ubọchi-izu-ike? ìzọputa ndu, ma-ọbu ib͕u eb͕u? Ma ha kpuchiri ọnu-ha.

5 Mb͕e O lesiri ha anya gburugburu n’iwe, ebe ọ nēwuta Ya nke-uku, bú na anēme ka obi-ha ma etili, O we si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di mbu.

6 Ndi-Farisi we pua, ngwa ngwa ha na ndi Herod we b͕a ìzù megide Ya, ka ha gēsi la Ya n’iyì.

7 Jisus we wezuga Onwe-ya, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, je oké osimiri: oké ọtutu madu si na Galili soro: oké ọtutu madu si kwa na Judia,

8 si kwa na Jerusalem, si kwa n’Aidumia, na ofè Jọdan, na buruburu Taia na Saidon, biakute Ya, mb͕e ha nuru ihe nile Ọ nēme, ka ha ra.

9 O we gwa ndi nēso uzọ-Ya okwu, ka otù ub͕o ntà di nēche Ya n’ihi ìgwè madu ahu, ka ha ghara ikpab͕u Ya:

10 n’ihi na O mereri ka aru ọtutu madu di ike; ya mere na ha dagidere Ya ka ha metu Ya aka, ka ha ra, bú ndi ajọ ọria di iche iche di n’aru.

11 Ọzọ, mb͕e ọbula ndi-mọ nādighi ọcha lere Ya anya, ha nāda n’ala n’iru Ya, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke.

12 Ọ nābasi-kwa-ra ha nba ike, ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè.

13 O we rigo n’ugwu ahu, kpọ ha biakute Ya, bú ndi Ya onwe-ya chọrọ: ha we jekuru Ya.

14 O we me ndikom iri na abua, ka Ya na ha we biri, ka O we nēzipu kwa ha ikwusa ozi ọma,

15 na inwe ike ichupu ndi-mọ ọjọ:

16 Saimon ka O nyekwasiri aha Pita;

17 na Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne Jemes; ha ka O nyekwasiri aha Boanajis, nke bu, Umu éb͕è-elu-igwe:

18 na Andru, na Filip, na Batọlọmiu, na Matiu, na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs, na Saimon Kananaiọs,

19 na Judas Iskariot, onye ra-kwa-ra Ya nye.

O we ba n’ulo.

20 Ìgwè madu we b͕akọ ọzọ, ya mere na ha apughi ọbuná iri nri.

21 Mb͕e ndi-ikwu-Ya nuru ya, ha we pua ijide Ya: n’ihi na ha nāsi, Anya adighi Ya nma.

22 Ndi-ode-akwukwọ ndi si na Jerusalem ridata we si, O nwere Beelzebul; ha si kwa, N’ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.

23 O we kpọ ha biakute Ya, si ha n’ilu di iche iche, Sètan Si aṅa pu ichupu Setan?

24 Ọzọ, ọ buru na ala-eze ekewa megide onwe-ya, ala-eze ahu apughi iguzo.

25 Ọ buru kwa na èzí-na-ulo ekewa megide onwe-ya, èzí-na-ulo ahu agaghi-apu iguzo.

26 Ọ buru kwa na Setan ebiliwo megide onwe-ya, we kewa, ọ pughi iguzo, kama o nwere ọgwugwu.

27 Ma ọ dighi onye ọ bula puru ibà n’ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u; mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n’ulo-ya.

28 N’ezie asim unu, Na agāb͕aghara umu madu nmehie-ha nile, na nkwulu-ha, ka ha ra, bú nke ha gēji kwulu:

29 ma onye ọ bula nke gēkwulu Mọ Nsọ enweghi nb͕aghara rue mb͕e ebighi-ebi, ma nmehie ebighi-ebi nātuhi ya:

30 n’ihi na ha nāsi, O nwere mọ nādighi ọcha.

31 Nne-Ya na umu-nne-Ya abia kwa; ha we guzo n’èzí, zigara Ya ozi, nākpọ Ya.

32 Ìgwè madu nānọ kwa Ya buruburu; ha we si Ya, Le, nne-Gi na umu-nne-Gi nọ n’èzí nāchọ Gi.

33 O we za ha, si, Ònye bu nnem na umu-nnem?

34 Mb͕e O lesiri ha anya buruburu, bú ndi nọ Ya buruburu, Ọ si, Le, nnem na umu-nnem!

35 N’ihi na onye ọ bula nke gēme ihe Chineke nāchọ, onye ahu bu nwa-nnem nwoke, na nwa-nnem nwanyi, na nnem.

Categories
MAK

MAK 4

1 Ọ we malite ọzọ izí ihe n’usọ oké osimiri. Oké ìgwè madu uku we zukọ n’ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n’ub͕o, we nọdu ala n’osimiri; ìgwè madu ahu nile we nọ n’usọ oké osimiri n’elu ala.

2 O we zí ha ọtutu ihe n’ilu di iche iche, si ha n’ozizí-Ya,

3 Nurunu: Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru:

4 o rue, mb͕e ọ nāgha, ufọdu dara n’akuku uzọ, anu-ufe we bia tuturie ha.

5 Nkpuru ọzọ we da n’ala nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne; ngwa ngwa ha we pulite, n’ihi na ha enweghi ájá di omimi:

6 ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n’ihi na ha enweghi nkpọrọgwu.

7 Nkpuru ọzọ we da n’etiti ogwu, ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha, ha amighi kwa nkpuru.

8 Nkpuru ọzọ we da n’ala di nma, ha we nāmi nkpuru, nētó nāba kwa uba; ha we mia, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise.

9 O we si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu.

10 Mb͕e nání Ya nọ, ndi nọ Ya buruburu na ndikom iri na abua ahu we jua Ya ilu ahu.

11 O we si ha, Ọ bu unu ka enyeworo ihe-omimi ala-eze Chineke: ma anēmere ndi nọ n’èzí ihe nile n’ilu:

12 ka ha we hu n’ọhuhu, ghara ihuta; ka ha we nu kwa n’ọnunu, ghara inuta; ka ha ghara ichighari mb͕e ọ bula, ewe gb͕aghara ha.

13 O we si ha, Ùnu amataghi ilu a? ùnu gēsi kwa aṅa mara ilum nile?

14 Ọgha-nkpuru nāgha okwu Chineke.

15 Ma ndia bu ndi nọ n’akuku uzọ ahu, ebe anāgha okwu ahu; ma mb͕e ọ bula ha nuru, ngwa ngwa Setan abia, we napu okwu nke aghaworo nime ha.

16 Otú ahu, ndia bu kwa ndi anāgha n’ebe nkume ahu, ndi, mb͕e ọ bula ha nuru okwu ahu, ngwa ngwa ha were ọṅù jide ya;

17 ma ha enweghi nkpọrọgwu nime onwe-ha, kama ha nānọ nwa oge; emesia, mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n’ihi okwu ahu, ngwa ngwa ha ma n’ọnyà.

18 Ndi ọzọ bu kwa ndi anāgha n’etiti ogwu ahu; ndia bu ndi nuru okwu ahu,

19 ma ncheb͕u nile nke oge a, na aghughọ nke àkù, na nbata nke agu ihe di iche iche ọzọ, nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.

20 Ndi ahu bu kwa ndi aghara n’ala ahu di nma; ndi ọ bula ndi nānu okwu ahu, we nara ya, we mia nkpuru, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise.

21 O we si ha, Ànēbute oriọna ka adọba ya n’okpuru mb͕é’, ma-ọbu n’okpuru ihe-ndina? ọ̀ bughi ka adọba ya n’elu ihe-idọba-oriọna?

22 N’ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, ma-ọbughi ka ewe me ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe emere ka ọ buru ihe ezoro ezo, kama ọ bu ka o we puta ìhè.

23 Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu.

24 O we si ha, Lezienu anya ihe unu nānu: ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu: agēnye kari kwa unu.

25 N’ihi na onye nwere, onye ahu ka agēnye: onye nēnweghi kwa, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

26 O we si, ọ bu otu a ka ala-eze Chineke di, ọ di ka mb͕e madu tupuru nkpuru n’ala;

27 we raru ura teta kwa abali na ehihie, nkpuru ahu we pue tó kwa, onye ahu amaghi ka o si me.

28 Ala nāmi nkpuru site n’onwe-ya; mbu npute, emesia oko, emesia ọka kara aka n’oko.

29 Ma mb͕e ọ bula nkpuru chara, ngwa ngwa o were mma-iwe-ihe-ubi webe, n’ihi na mb͕e owuwe-ihe-ubi abiawo.

30 O we si, Ayi gēsi aṅa tunyere ala-eze Chineke? ma-ọbu n’ìlu gini ka ayi gātu ya?

31 Ọ di ka nkpuru mustard, nke, mb͕e ọ bula aghara ya n’ala, ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile di n’ala;

32 ma mb͕e ọ bula aghara ya, o tó, ghọ ihe bùkari ihe nile anāku n’ubi, o we waputa oké alaka; nke mere ka anu-ufe nile nke elu-igwe pu inọ n’okpuru ǹdò-ya.

33 O nēji kwa ọtutu ilu di otú a gwa ha okwu Chineke, dika ha puru inu ya:

34 ma asi na O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu: ma mb͕e Ya na ha nọ iche Ọ nākọrọ ndi nke Ya nēso uzọ-Ya ihe nile.

35 N’ubọchi ahu, mb͕e o ruru anyasi, O we si ha, Ka ayi gabiga n’ofè ọzọ.

36 Ha we rapu ìgwè madu ahu, we kuru Ya, otú di, tiyere onwe-ha n’ub͕ọ ahu. Ub͕ọ ufọdu ọzọ di kwa nke nēso Ya.

37 Oké ajọ ifufe we fe, ebili-miri we nāwubà n’ub͕o ahu, ya mere na miri nēju n’ub͕ọ ub͕u a.

38 Ma Ya onwe-ya nọ n’isi ub͕ọ, nāraru ura n’elu ohiri-isi: ha we kpọte Ya, Si Ya, Onye-ozizí, Ò metughi Gi n’obi na ayi nāla n’iyì?

39 O we teta, bara ifufe nba, si kwa oké osimiri, Di jū, kpuchie ọnu-gi. Ifufe we febìe, oké ndaju we di.

40 O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ? ùnu akēnweghi okwukwe?

41 Ha we tua oké egwu, sirita onwe-ha, Ònye bu kwa onye a, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?

Categories
MAK

MAK 5

1 Ha we bia rue ofè ọzọ nke oké osimiri ahu, n’ala ndi Gerasa.

2 Mbe Ọ putasiri n’ub͕ọ, ngwa ngwa nwoke nke di n’aka mọ nādighi ọcha we si n’ebe anēlì ozu zute Ya,

3 nwoke ahu nwere ebe-obibi-ya n’ebe ahu anēlì ozu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru ike ya ab͕u ọzọ, ọbuná ma ewere nkpọrọ;

4 n’ihi na ewereri nkpọrọ-ukwu na nkpọrọ ke ya ọtutu mb͕e, o we nyajipusia nkpọrọ nile, kujisia nkpọrọ-ukwu nile: ọ dighi kwa onye ọ bula di ike imeju ya anya.

5 Mb͕e nile, abali na ehihie, o nēti kwa nkpu, were kwa nkume nēyikasi onwe-ya, n’ebe anēlì ozu na n’ugwu.

6 Mb͕e ọ huru Jisus n’ebe di anya, o we b͕a ọsọ, kpọ isi ala nye Ya;

7 mb͕e o tisiri nkpu n’oké olu, o we si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? Ewerem Chineke b͕a Gi iyi, emekpalam aru.

8 N’ihi na Ọ nāsi ya, Si nime nwoke a puta, gi mọ nādighi ọcha.

9 O we jua ya, Òle aha-gi? Ọ si Ya, Aham bu Legion; n’ihi na ayi di ọtutu.

10 Ọ we riọsie Ya ike ka Ọ ghara izipu ha n’ala ahu.

11 Ma oké ìgwè ezì di n’ebe ahu na nso ugwu ahu nāta nri.

12 Ha we riọ Ya, si, Ziga ayi nime ìgwè ezì ahu, ka ayi we ba nime ha.

13 O we kwere ha. Ndi-mọ ahu nādighi ọcha we puta, je ba n’ìgwè ezì ahu: ìgwè ezì we nudà n’ebe ahu di nkputankpu dabà n’oké osimiri, ha ruru dika nnù ise; miri we b͕ab͕ue ha.

14 Ndi nāzù ha we b͕alaga, kọsa ya n’obodo ahu na n’ubi. Ha we bia ihu ihe ọ bu, bú nke emereri.

15 Ha we biakute Jisus, le onye ahu ndi-mọ ọjọ ji ka ọ nọduru ala, yiri uwe, uche-ya zu-kwa-ra okè, bú onye nwere legion ahu: ha we tua egwu.

16 Ndi huru ya we kọrọ ha otú emere onye ahu ndi-mọ ọjọ ji, na okwu ìgwè ezì ahu.

17 Ha we malite iriọ Ya ka Ọ pua n’ókè-ala-ha.

18 Mb͕e Ọ nābà nime ub͕ọ, onye ahu ndi-mọ ọjọ jiri na mbu we riọ Ya ka ya na Ya biri.

19 Ma O kweghi ya, kama Ọ si ya, La n’ulo-gi, lakuru ndi nke gi, kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Onye-nwe-ayí meworo gi, na otú O mere gi ebere.

20 O we je, malite ikwusa na Dekapọlis ihe Jisus mere ya, ka ha ra: o we ju madu nile anya.

21 Mb͕e Jisus gasiri ọzọ n’ub͕ọ ahu n’ofè ọzọ, oké ìgwè madu we zukọ n’ebe Ọ nọ: O we nọ n’usọ oké osimiri.

22 Otù nime ndi-isi ulo-nzukọ, aha-ya bu Jeairọs, we bia; mb͕e ọ huru Ya, o we da n’ala n’ukwu-Ya,

23 we riọsie Ya ike, si, Nwam nwanyi ntà nānwunyu anya: ariọm I ka I bia bikwasi ya aka-Gi abua, ka ewe zọputa ya, o we di ndu.

24 O we so ya je; oké ìgwè madu we nēso Ya, ha nākpab͕u kwa Ya.

25 Otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua,

26 nke hu-kwa-rari ọtutu ahuhu n’aka ọtutu dibia, mefusia ihe nile o nwere, ma ọ baghi ya urù ọ bula, kama ọ jọkaria ya njọ,

27 ebe ọ nuru ihe nile banyere Jisus, o we bia n’azu Ya n’etiti ìgwè madu ahu, we metu uwe-Ya aka.

28 N’ihi na ọ nāsi, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam.

29 Ngwa ngwa isi ọbara-ya kọsia; o we mara n’aru-ya na emere ya ka aru di ya ike n’ajọ ọria ahu.

30 Ngwa ngwa, ebe Jisus mazuru na ike nke nēsi nime Ya puta apuwori, O chigharia n’ìgwè madu ahu, we si, Ònye meturu uwem aka?

31 Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, I huwo ìgwè madu a ka ha nākpab͕u Gi, I nāsi kwa, Ònye meturum aka?

32 O we le anya gburugburu ka Ọ hu nwanyi nke mere ihe a.

33 Ma nwanyi ahu, ebe ọ matara ihe emere ya-ri, ọ tua egwu, ma kwa jijiji, bia da n’iru Ya, gwa Ya ezi-okwu nile.

34 Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n’udo, si n’ajọ ọria-gi nwe aru di ike.

35 Mb͕e Ọ kpu okwu n’ọnu, ha si n’ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwanyi anwuruwo: gini mere i nēsob͕u Onye-ozizí a ọzọ kwa?

36 Ma Jisus aṅaghi nti n’okwu anēkwu, Ọ si onye-isi ulo-nzukọ ahu, Atula egwu, kwere nání.

37 O kweghi kwa onye ọ bula so Ya je, ma-ọbughi Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne Jemes.

38 Ha we bia ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu; O we hu ùzù, na ọtutu madu ka ha nākwa ákwá nēti kwa nkpu nke-uku.

39 Mb͕e Ọ batasiri, O we si ha, Gini mere unu nātu ùzù, nākwa kwa ákwá? nwatakiri ahu anwughi anwu, kama ọ nāraru ura.

40 Ha we chìa Ya ọchì. Ma mb͕e Ọ chupusiri ha nile, Ọ kuru nna nwatakiri ahu na nne-ya na ndi Ya na ha yikọ, we ba n’ebe nwatakiri ahu di.

41 O we jide nwatakiri ahu n’aka, si ya, Talita kumi; nke bu, ma asugharia ya, Nwa-ab͕ọghọ ntà, asim i, Bilie.

42 Ngwa ngwa nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie, jeghari kwa; n’ihi na ọ b͕ara arọ iri na abua. Ngwa ngwa ibobo we nwubiga ha nile ókè n’aru

43 O we gwasie ha ike ka onye ọ bula ghara imara nka: O we si ka enye ya ihe-oriri.

Categories
MAK

MAK 6

1 O we si n’ebe ahu pua; O we bia n’ala nke aka Ya; ndi nēso uzọ-Ya so kwa Ya.

2 Mb͕e ubọchi-izu-ike ruru, O we malite izi ihe n’ulo-nzukọ-ha: mb͕e ha nuru Ya ibobo we nwua ọra madu n’aru, ha si, Òle ebe ka Nwoke a nwere ihe ndia? ha si kwa, Gini bu amam-ihe enyere Nwoke a? òle isi ọlu ike di otú a aluru n’aka-Ya?

3 Nwoke a, Ọ̀ bughi onye-ọ̀kà ahu, nwa Meri, na nwa-nne Jemes, na Joses, na Judas, na Saimon? umu-nne-Ya ndinyom, hà anọghi kwa n’ebe a n’etiti ayi? Ewe me ka ha ma n’ọnyà n’aru Ya.

4 Jisus we si ha, Onye-amuma abughi onye adighi-asọpuru, ma-ọbughi n’ala nke aka ya, na n’etiti ikwu-ya, na n’ulo-ya.

5 Ọ pughi kwa ilu ọlu di ike ọ bula n’ebe ahu, ma-ọbughi na O bikwasiri ndi-nriaria ole-na-ole aka-Ya abua, we me ka aru di ha ike.

6 Ekweghi-ekwe-ha we ju Ya anya.

Ọ nējeghari kwa obodo ntà nile ha buruburu nēzí ihe.

7 Ọ we kpọ ndi-ozi iri na abua ahu biakute Ya, O we malite izipu ha abua abua; O nye-kwa-ra ha ike n’ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ;

8 O we nye ha iwu ka ha ghara iwere ihe ọ bula n’ije-ha, ma-ọbughi nání nkpa-n’aka; ka ha ghara iwere ob͕e achicha, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ego n’ihe-ọkiké-ha;

9 ma ka ha je nēyi akpukpọ-ukwu sandal: Ọ si ha, Unu eyi-kwa-la uwe-ime abua.

10 O we si ha, Ebe ọ bula unu gābà n’ulo, nọgide n’ulo ahu rue mb͕e unu putara n’ebe ahu.

11 Ma ebe ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, ebe ha anughi kwa okwu-unu, mb͕e unu nāpu n’ebe ahu, tichapu ájá di n’okpuru ukwu-unu ka ọ buru ha àmà.

12 Ha we pua, kwusa ka madu chègharia.

13 Ha nāchupu kwa ọtutu mọ ọjọ, were kwa manu olive te ọtutu ndi-nriaria, we me ka aru di ha ike.

14 Herod, bú eze, we nu, n’ihi na aha-Ya putara ìhè: o we si, Jọn onye nēme baptism, emewo ka o si na ndi nwuru anwu bilie, n’ihi nke à ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya.

15 Ma ndi ọzọ si, Ọ bu Elaija. Ndi ọzọ si kwa, Ọ bu onye-amuma, dika otù nime ndi-amuma.

16 Ma mb͕e Herod nuru ya, ọ si, Jọn, onye mu onwem bipuru isi-ya, emere onye ahu ka o si n’ọnwu bilie.

17 N’ihi na Herod onwe-ya zipururi jide Jọn, we ke ya ab͕u n’ulo-nkpọrọ n’ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya: n’ihi na ọ luru ya na nwunye.

18 N’ihi na Jọn nāsi Herod, O zighi gi ezi n’iwu inwe nwunye nwa-nna-gi.

19 Ma Herodias dobere ya iwe n’obi, ọ chọ-kwa-ra ib͕u ya; ma ọ pughi;

20 n’ihi na Herod nātu egwu Jọn, ebe ọ matara na ọ bu nwoke nke bu onye ezi omume na onye di nsọ, ọ nēdebe kwa ya nke-ọma. Ọzọ, mb͕e ọ nuru okwu-ya, ọ nēchè uche nke-uku; o were kwa obi-utọ nānu ya.

21 Ma mb͕e ubọchi di oghere ruru, mb͕e Herod siri nri-anyasi na ncheta-ọmumu-ya nye ndi-amadi-ya, na ndi-ọchi-agha, na ndi-isi nke Galili;

22 mb͕e nwa-nwanyi Herodias onwe-ya bata-kwa-ra, te egwú, o we tọ ha utọ, bú Herod na ndi ya na ha nānọdu na nri; eze we si nwa-ab͕ọghọ ntà ahu, Riọm ihe ọ bula i nāchọ, na m’gēnye gi ya.

23 O we ṅuara ya iyi, si, Ihe ọ bula i gāriọm, m’gēnye gi ya, rue nkera nke ala-ezem.

24 O we pua, si nne-ya, Gini ka m’gāriọrọ onwem? O we si, Isi Jọn onye nēme baptism.

25 O were ọsọ bata ngwa ngwa n’ebe eze ahu nọ, we riọ, si, Anamachọ ka i nyem isi Jọn Baptist n’ọkwa ub͕u a.

26 O we wuta eze ahu n’obi nke-uku; ma n’ihi iṅu-iyi-ya nile, na n’ihi ndi nọduru na nri, ọ chọghi iju ya.

27 Ngwa ngwa eze we zipu onye-agha nēche nche, nye ya iwu ibaute isi-ya: o we je we bipu isi-ya n’ulo-nkpọrọ,

28 we bute isi-ya n’ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we nye ya nne-ya.

29 Mb͕e ndi nēso uzọ-ya nuru ya, ha we bia būru ozu-ya, tọb͕ọ ya n’ílì.

30 Ndi-ozi Jisus we zukọ n’ebe Jisus nọ; ha we kọrọ Ya ihe nile, ka ihe ha mere ra, ka ihe ha ziri ra kwa.

31 O we si ha, Unu onwe-unu bia ichè n’ebe bu ọhia, ka unu zuru ike nke-ntà. N’ihi na ọtutu madu nābia nāla kwa, oghere adighi kwa ha ọbuná iri ihe.

32 Ha we je n’ub͕ọ-ha iche rue ebe bu ọhia.

33 Ma ọtutu madu huru ha mb͕e ha nēje, ha mata-kwa-ra ha, we si n’obodo ahu nile b͕akọta n’ebe ahu n’ukwu ala, buru ha uzọ.

34 O we puta, hu oké ìgwé madu, O we nwe ọmiko n’aru ha, n’ihi na ha di ka aturu nēnweghi onye nāzù ha: O we malite izí ha ọtutu ihe.

35 Mb͕e chi nēji nb͕u a, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si, Ebe a bu ọhia, chi nēji kwa ub͕u a:

36 zilaga ha, ka ha we je n’ubi na obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe ha gēri.

37 Ma Ọ zara, si ha, Unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si Ya, Àyi gēe izuta ob͕e achicha nke ọgu shilling iri, nye ha ka ha rie?

38 Ọ si ha, Òb͕e achicha ole ka unu nwere? jenu, le. Mb͕e ha mara, ha si, Ise, na azù abua.

39 O we gwa ha ka madu nile nọdu ala n’òtù di iche iche n’elu ahihia ndu.

40 Ha we nọdu ala n’ahiri di iche iche, ọgu ise ọgu ise, na ọgu abua na iri ọgu abua na iri.

41 O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n’elu-igwe, gọzie ha, nyawa ob͕e achicha ahu; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n’iru ndi ahu; O we kère ha nile azù abua ahu.

42 Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha.

43 Ha we tutukọ iberibe nile, njuputa nkata iri na abua, na nke azù abua ahu.

44 Ma ndi riri ob͕e achicha ise ahu bu nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri.

45 Ngwa ngwa o we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n’ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n’ofè ọzọ na Betsaida, mb͕e Ya onwe-ya nēzilaga ìgwè madu ahu.

46 Mb͕e O kelesiri ha, O jere n’ugwu ahu ikpe ekpere.

47 Mb͕e o ruru anyasi, ub͕ọ ahu we di n’etiti oké osimiri, nání Ya onwe-ya nọ kwa n’ala.

48 Mb͕e Ọ huru ha ka ha nādọb͕u onwe-ha n’ọnyinya-ub͕o-ha, n’ihi na ifufe nēfegide ha, O we biakute ha dika nche nke-anọ n’abali, nēje ije n’elu oké osimiri; O we chọ igabiga ha:

49 ma mb͕e ha huru Ya ka Ọ nēje ije n’elu oké osimiri, ọ di ha ka Ọ bu mọ, ha we tisie nkpu ike:

50 n’ihi na ha nile huru Ya, obi we lọ ha miri. Ma Ọ kpayere ha uka ngwa ngwa, si ha, Nwenu obi-ike: ọ bu Mu; unu atula egwu.

51 O we rigokuru ha n’ub͕ọ; ifufe we febìe: ibobo we nwubiga ha ókè n’aru ri nne n’onwe-ha;

52 n’ihi na ha aghọtaghi ọlu ebube nke ob͕e achicha ise, kama emereri ka obi-ha me etili.

53 Mb͕e ha gabigasiri, ha bia rue ala rue Genesaret, tinye ub͕ọ-ha n’ala.

54 Mb͕e ha putara n’ub͕ọ, ngwa ngwa ọra we mazu Ya,

55 we b͕aghari n’ala ahu dum, malite ibughari ndi aru nādighi nma n’ute-ha, n’ebe ha nuru na Ọ nọ.

56 Ebe ọ bula Ọ batara, n’obodo ntà, ma-ọbu n’obodo, ma-ọbu n’ubi, ha we nātọb͕ọ ndi aru-ha nādighi ike n’ọma-ahia, ha nāriọ kwa Ya ka ha metu ọbuná ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ewe zọputa ha, ka ha ra, bú ndi meturu Ya aka.

Categories
MAK

MAK 7

1 Ha we zukọ n’ebe Ọ nọ, bú ndi-Farisi, na ufọdu nime ndi-ode-akwukwọ, ndi siri na Jerusalem bia,

2 ndi hu-kwa-ra na ufọdu nime ndi nēso uzo-Ya nēri nri-ha n’aka ruru árú, nke ahu bu, aka anākwọghi akwọ.

3 N’ihi na ndi-Farisi, na ndi-Ju nile, ọ buru na ha akwọchaghi aka-ha, ha adighi-eri ihe, n’ihi na ha nējide ozizí nke ndi-okenye nyere ha n’aka idebe:

4 ọzọ, mb͕e ha si n’ahia lata, ọ buru na ha efesaghi onwe-ha miri, ha adighi-eri ihe: ọtutu ihe ọzọ di kwa, nke ha natara ijide, dika ime iko, na ite, na ihe ọla, baptism.

5 Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we jua Ya, si, N’ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējeghi ije dika ozizí ndi-okenye nyere ayi n’aka idebe, ma ha nēri nri-ha n’aka ruru árú?

6 Ma Ọ siri ha, Aisaia buru amuma nke-ọma n’isi unu ndi-iru-abua, dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Ndi nka nāsọpurum n’eb͕ub͕ere-ọnu-ha,

Ma obi-ha di anya n’ebe M’nọ.

7 Ma ha nēbirim isi ala n’efu,

Nēzí ihe madu nyere n’iwu ka ha buru ozizí-ha.

8 Unu nārapu ihe Chineke nyere n’iwu, jide kwa ozizí madu nyere n’aka-unu idebe.

9 O we si ha, Unu nāju ihe Chineke nyere n’iwu nke-ọma, ka unu we debe ozizí nke enyere n’aka-unu idebe.

10 N’ihi na Moses siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi; na, Onye kwujọrọ nna ma-ọbu nne, ya nwua ọnwu ahu:

11 ma unu onwe-unu nāsi, Ọ buru na madu si nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n’akam bu Kọban, isi-ya bu, Ihe enyere Chineke;

12 unu ekweghi ya ọzo ka o mere nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe ọ bula:

13 nēme okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu site n’ozizí enyere unu n’aka idebe, nke unu nyere madu n’aka idebe: ọtutu ihe di otú a ka unu nēme kwa.

14 O we kpọ ìgwè madu ahu ọzọ biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu okwum, unu nile, ghọta-kwa-nu:

15 ọ dighi ihe ọ bula di madu n’ìhè nke puru imeru ya, ma ọ buru na ọ ba nime ya: kama ihe si nime madu puta bu ihe nēmeru madu.

16 Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu.

17 Mb͕e Ọ ghara ìgwè madu ahu ba n’ulo, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya isi ilu ahu.

18 O we si ha, Ùnu onwe-unu di kwa otú a ka ndi nēnweghi nghọta? Ùnu atugharighi uche-unu, na ihe ọ bula nke si n’ìhè ba nime madu, na ọ pughi imeru ya,

19 n’ihi na ọ bàghi n’obi-ya, kama n’afọ-ya, o we pua n’ulo-ǹsí? O kwuru nka, ka O me ka ihe-oriri nile di ọcha.

20 O we si, Ihe nke si nime madu puta, nke ahu nēmeru madu.

21 N’ihi na n’ime, bú n’obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile,

22 ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche:

23 ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa, ha nēmeru madu.

24 O we si n’ebe ahu bilie, je n’ókè-ala Taia na Saidon. O we ba n’ulo, Ọ chọghi kwa ka onye ọ bula mara: ma apughi izota Ya.

25 Ma ngwa ngwa otù nwanyi, nke nwa-ya nwanyi nke-ntà nwere mọ nādighi ọcha, ebe ọ nuru ùdé-Ya, ọ bia da n’ala n’ukwu-Ya.

26 Ma nwanyi ahu bu onye-Grik, buru onye Sairo-Finisia n’ọmumu-ya. O we kpere Ya ka Ọ chupu mọ ọjọ ahu n’aru nwa-ya nwanyi.

27 O we si ya, Kwe ka afọ buru uzọ ju umu: n’ihi na ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita.

28 Ma ọ zara, si Ya, E, Onye-nwe-ayi: ọbuná umu-nkita n’okpuru table nēri irighiri ufọdu na nri umu ntà.

29 O we si ya, N’ihi okwu a laba; mo ọjọ ahu apuwo n’aru nwa-gi nwanyi.

30 O we la n’ulo-ya, hu nwatakiri-ya na atọb͕ọrọ ya n’elu ihe-ndina-ya, hu kwa na mọ ọjo ahu apuwori.

31 O si-kwa-ra n’ókè-ala Taia pua ọzọ, we gabiga n’etiti Saidon, si n’etiti ókè-ala Dekapọlis, rue oké osimiri Galili.

32 Ha we kutara Ya otù onye nti chiri, nke nāsu kwa nsu; ha we riọ Ya ka O bikwasi ya aka-Ya.

33 O we si n’igwè madu ahu kupu ya iche, we tiye nkpisi-aka-Ya na nti-ya abua, bu kwa ọnu-miri, metu ire-ya;

34 O we le anya n’elu-igwe, sua udè, si ya, Efata, nke isi-ya bu, Ghere oghe.

35 Nti-ya abua we ghere oghe, ekike ire-ya tọpu kwa, o we kwuzi okwu.

36 O we gwasie ha ike ka ha ghara igwa onye ọ bula: ma ka ọ ra, bú otú Ya onwe-ya gwasiri ha ike, otú a ka ha nēkwusa kari ya nke-uku.

37 Ibobo nwubiga-kwa-ra ha ókè n’aru, ha si, O mewo ihe nile nke-ọma: Ọ nēme ọbuná ndi nti chiri ka ha nu ihe, me kwa ndi nāpughi ikwu okwu ka ha kwue.

Categories
MAK

MAK 8

1 Na mb͕e ahu, mb͕e oké ìgwè madu di kwa ọzọ, mb͕e ha nēnweghi kwa ihe ha gēri, Ọ kpọrọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, si ha,

2 Enwerem ọmiko n’aru ìgwè madu a, n’ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri:

3 ọ buru kwa na ezilagam ha n’ulo-ha n’ọnu efu, ha gāda #mbà n’uzọ; ufọdu nime ha si kwa n’ebe di anya bia.

4 Ndi nēso uzọ-Ya we za Ya, si, Ọle ebe ka madu gēsi pu inwe ob͕e achicha inyeju ndia afọ nime ọhia ebe a?

5 O we jua ha, si, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa.

6 O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala: O we nara ob͕e achicha asa ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ka ha debe n’iru ha; ha we debe ha n’iru ìgwè madu ahu.

7 Ha nwe-kwa-ra azù ntà ole-na-ole: O we gọzie ha, si ka edebe kwa ndia n’iru ha.

8 Ha we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ iberibe fọduru, abọ asa.

9 Ma ndi ahu ra ka nnù iri: O we zilaga ha.

10 Ngwa ngwa Ya na ndi nēso uzọ-Ya we ba n’ub͕ọ-ha, bia n’akuku Dalmanuta.

11 Ndi-Farisi we puta, malite iju Ya ajuju, nāchọ ihe-iriba-ama n’aka-Ya site n’elu-igwe, n’inwa Ya.

12 O we sua udè nke-uku na mọ-Ya, si, Gini mere ọb͕ọ a nāchọ ihe-iriba-ama? n’ezie asim unu, Agaghi-enye ọb͕ọ a ihe-iriba-ama.

13 O we rapu ha, ba kwa n’ub͕ọ ọzọ, we gabiga n’ofè ọzọ.

14 Ha we chezọ iwere ob͕e achicha; ha enweghi kwa n’aka-ha nime ub͕ọ ihe kariri otù ob͕e achicha.

15 O we gwasie ha ike, si, Nēlenu anya, lezienu anya ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, na ihe Herod, bú ihe nēko achicha.

16 Ha we nēkwurita n’etiti onwe-ha, si, Ọ bu n’ihi na ayi enweghi ob͕e achicha.

17 Ebe Jisus mara ya Ọ si ha, Gini mere unu nēkwurita n’onwe-unu, n’ihi na unu enweghi ob͕e achicha? ùnu akātugharighi uche, ùnu akāghọtaghi kwa? èmere obi-unu etili?

18 Unu ahughi uzọ mb͕e unu nwere anya? ùnu anughi kwa ihe mb͕e unu nwere nti? ùnu echetaghi kwa?

19 Mb͕e M’nyawara ob͕e achicha ise nye nnù madu iri na nnù abua na ọgu iri, ǹkata ole juputara n’iberibe ka unu bulitere? Ha si Ya, Iri na abua.

20 Mb͕e M’nyawara asa nye nnù madu iri, ìberibe juputara abọ ole ka unu tutukọrọ? Ha we si Ya, Asa.

21 O we si ha, Ùnu akāghọtaghi?

22 Ha we bía na Betsaida. Ha we kutara Ya onye-ìsì, riọ Ya ka O metu ya aka.

23 O we jide onye-ìsì ahu n’aka, duputa ya n’obodo ntà ahu; mb͕e Ọ busara ya ọnu-miri n’anya, bikwasi kwa ya aka-Ya abua, O we jua ya, si, Ọ̀ di ihe i huru?

24 O we le anya n’elu, si, Ahurum madu; n’ihi na ahurum ha dika osisi, ha nējeghari.

25 Mb͕e ahu O bikwasiri aka-Ya abua n’anya-ya ọzọ; o we legide anya, eme kwa ka anya-ya di ka ha di na mbu, o we hucha ihe nile.

26 O we zilaga ya n’ulo-ya, si, Abàla ọbuná n’obodo ntà nke à.

27 Jisus we pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, ba n’obodo ntà nile nke Sisaria Filipi: mb͕e ha nọ n’uzọ O we jua ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Onye ka madu nāsi na Mu onwem bu?

28 Ha we gwa Ya, si, Jọn Baptist: ndi ọzọ si kwa, Elaija; ma ndi ọzọ si, Otù nime ndi-amuma.

29 Ya onwe-ya we jua ha, si, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si Ya, Gi onwe-gi bu Kraist ahu.

30 O we dọ ha aka na nti ka ha ghara igwa onye ọ bula okwu bayere Ya.

31 O we malite izí ha, na Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, na ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, na aghaghi ib͕u Ya, na Ọ ghaghi kwa isi n’ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.

32 Ọ nēkwuwa kwa, okwu ahu. Pita we kuru Ya nye n’aru, malite ibara Ya nba.

33 Ma mb͕e O chighariri, hu ndi neso uzọ-Ya, Ọ bara Pita nba si, Ga n’azum, Setan: n’ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n’ihe Chineke, kama ọ bu n’ihe madu.

34 O we kpọ ìgwè madu ahu, ha na ndi nēso uzọ-Ya, ka ha biakute Ya, Ọ si ha, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n’azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam.

35 N’ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n’ihim na n’ihi ozi ọma nkem, ọ gāzọputa ya.

36 N’ihi na ùrù gini ka ọ bara madu, irita elu-uwa dum n’urù, ewe napu ya ndu-ya?

37 N’ihi na ìhe-nb͕anwe gini ka madu gēji b͕anwe ndu-ya?

38 N’ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme n’ọb͕ọ a nke nākwa iko, nke nēmehie kwa, ihere onye ahu gēme kwa Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n’ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi mọ-ozi-Ya di nsọ.

Categories
MAK

MAK 9

1 O we si ha, N’ezie asim unu, Na n’etiti ndi guzoro nso ufọdu di n’ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli, rue mb͕e ha gāhu ala-eze Chineke ka ọ biaworo n’ike.

2 Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n’ugwu di elu we pua iche, nání ha: O we nwogha n’iru ha:

3 uwe-Ya nile we nēnwupu, nācha oké ucha; dika onye ọ bula nke nēme ka ákwà di ocha n’uwa nāpughi ime ka ha di ọcha.

4 Ewe me ka ha hu Elaija na Moses: ha na Jisus nēkwurita kwa okwu.

5 Pita we za, si Jisus, Rabai, ọ di nma ka ayi nọ n’ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija.

6 N’ihi na ọ maghi ihe ọ gāza; n’ihi na ha nātu oké egwu.

7 Igwe-oji we bia kpuchie ha: olu we si n’igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya: nurunu okwu-Ya.

8 Na mberede, mb͕e ha lere anya buruburu, ha ahughi onye ọ bula ọzọ, ma-ọbughi nání Jisus, Ya na ha.

9 Mb͕e ha si n’ugwu ahu nārida, O we gwasie ha ike ka ha ghara ikọrọ onye ọ bula ihe ha hururi, ma-ọbughi mb͕e Nwa nke madu gēsiwori na ndi nwuru anwu bilie.

10 Ha we jide okwu ahu, nājurita onwe-ha ihe isi-na-ndi-nwuru-nawu-bilie bu.

11 Ha we jua Ya, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Elaija aghaghi ibu uzọ bia?

12 O we si ha, Ọ bu ezie na Elaija bu uzọ bia, nēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu: èsiwo kwa aṅa ede okwu a bayere Nwa nke madu n’akwukwọ nsọ, na Ọ gāhu ọtutu ahuhu, eme kwa Ya ihe-efu?

13 Ma asim unu, na Elaija abiawo, ha me-kwa-ra ya ka ihe ha chọrọ ra, dika edeworo okwu bayere ya n’akwukwọ nsọ.

14 Mb͕e ha biakutere ndi nēso uzọ-Ya, ha we hu oké ìgwè madu ka ha nọ ha buruburu, ha hu kwa ndi-ode-akwukwọ ka ha nāju ha ajuju.

15 Ngwa ngwa ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile si-ike n’aru, mb͕e ha huru Ya, ha we b͕akuru Ya, kele Ya.

16 O we jua ha, si, Àjuju gini ka unu nāju ha?

17 Otù nwoke we si n’ìgwè madu ahu za Ya, si, Onye-ozizi, ekutaram I nwam nwoke, nke nwere mọ nādighi-ekwu okwu;

18 ebe ọ bula o jidere ya, o we tie ya n’ala: ọ nāsu kwa ufufu n’ọnu, nāta kwa ikekere-ezé, nāta kwa aru: m’we gwa ndi nēso uzọ-Gi ka ha chupu ya; ma ba enweghi ike.

19 O we za ha, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ? rùe ole mb͕e ka M’gānagide unu? unu kutaram ya.

20 Ha we kuru ya biakute Ya: mb͕e ọ huru Ya, ngwa ngwa mọ ahu we sesie ya ike; o we da n’ala, nāturu, nāsu kwa ufufu.

21 O we jua nna-ya, si, Ò ruru ole mb͕e ihe a meworo ya? O we si, Site na nwata.

22 Ọtutu mb͕e ọ tubà-kwa-ra ya n’ọku na nime miri, ila ya n’iyì: ma ọ buru na I puru ime ihe, nwe ọmiko n’aru ayi, nyere ayi aka.

23 Ma Jisus siri ya, Ọ buru na I puru! Onye nke kwere puru ime ihe nile.

24 Ngwa ngwa nna nwatakiri ahu tiri nkpu, si, Ekwem; nyere ekweghi-ekwem aka.

25 Ma mb͕e Jisus huru na ìgwè madu nāb͕akọta, Ọ bara mọ ahu nādighi ọcha nba, si ya, Gi mọ nādighi-ekwu okwu na nke nti chiri, Mu onwem nēnye gi iwu, si nime ya puta, abà-kwa-la nime ya ọzọ.

26 Mb͕e o tisiri nkpu, sesi kwa ya ike, o we puta: nwa ahu we di ka ozu; ya mere ndi ka nime ha si, Ọ nwuruwo.

27 Ma Jisus jidere ya n’aka, palie ya elu; o we bilie.

28 Mb͕e Ọ batara n’ulo-ha, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya iche, si, Gini mere ayi onwe-ayi apughi ichupu mọ ahu?

29 O we si ha, Aha mọ nka apughi iputa site n’ihe ọ bula, ma-ọbughi site n’ekpere.

30 Ha we si n’ebe ahu pua, gabiga n’etiti Galili; Ọ chọghi kwa ka onye ọ bula mara.

31 N’ihi na Ọ nēzí ndi nēso uzọ-Ya ihe, si ha, Anārara Nwa nke madu nye n’aka madu, ha gēb͕u kwa Ya; mb͕e eb͕usiri Ya, Ọ gēsi n’ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.

32 Ma ha aghọtaghi okwu ahu, ha nātu kwa egwu iju Ya.

33 Ha we bia rue Kapanaum: mb͕e Ọ nọ, n’ulo-ha O we jua ha, si, Gini ka unu nēkwurita n’uzọ?

34 Ma ha kpuchiri ọnu-ha: n’ihi na ha nārurita uka n’uzọ onye ka ibe-ya n’etiti ha.

35 Ọ we nọdu ala, kpọ ndi-ozi iri na abua ahu; O we si ha, Ọ buru na onye ọ bula nācho ka ọ buru onye-isi, ọ gābu onye-ikpe-azu n’etiti unu nile, na onye nējere unu nile ozi.

36 O we kuru nwatakiri debe ya n’etiti ha: mb͕e O kusiri ya n’aka-Ya, Ọ si ha,

37 Onye ọ bula nke gānara otù nime umu-ntakiri di otú a n’aham nke-ọma, ọ bu Mu onwem ka Ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma, ọ bughi Mu ka ọ nānara nke-ọma, kama ọ bu Onye ziterem.

38 Jọn siri Ya, Onye-ozizí, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n’aha-Gi: ayi we b͕ochie ya, n’ihi na ọ dighi-eso ayi.

39 Ma Jisus siri, Unu eb͕ochila ya: n’ihi na ọ dighi onye ọ bula nke gālu ọlu di ike n’aham, nke gāpu kwa ikwujọm ọsọsọ.

40 N’ihi na onye nādighi-emegide ayi diri ayi.

41 N’ihi na onye ọ bula nke gēkuru otù iko miri nye unu ṅua, n’ihi na unu bu ndi nke Kraist, n’ezie asim unu, na ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.

42 Ọzọ, onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwerenu ka ọ ma n’ọnyà, ọ gāka ya nma ma ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n’olu, tubà ya n’oké osimiri.

43 Ọzọ ọ buru na aka-gi eme gi ka i ma n’onyà, bipu ya: o di gi nma ibà na ndu n’ọlusi, kari inwe aka-gi abua ba n’ọku ala-mọ, n’ọku anyughi-anyu;

44 ebe ikpuru-ha nādighi-anwu, ọku-ha adighi-anyu kwa anyu.

45 Ọ buru kwa na ukwu-gi eme gi ka i ma n’ọnyà, bipu ya: ọ di gi nma ibà na ndu na ngwurọ, kari inwe ukwu-gi abua atubà gi n’ọku ala-mọ;

46 ebe ikpuru-ha nādighi-anwu, ọku-ha adighi-anyu kwa anyu.

47 Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n’ọnyà, tupu ya: ọ di gi nma ibà n’ala-eze Chineke nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n’ọku ala-mọ;

48 ebe ikpuru nke nēri ha nādighi-anwu, ọku anyughi kwa anyu.

49 N’ihi na agēji ọku b͕a onye ọ bula nnú.

50 Nnú di nma: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, gini ka unu gēji me ya ka ọ di utọ? Nwenu nnú nime unu, unu na ibe-unu di kwa n’udo.

Categories
MAK

MAK 10

1 O we si n’ebe ahu bilie, bia n’ókè-ala Judia, ya na ofè ọzọ nke Jọdan: ìgwè madu nile we zukọ ọzọ n’ebe Ọ nọ; ka O siri eme, O we nēzí ha ihe ọzọ.

2 Ndi-Farisi we biakute Ya, jua Ya, si, Ò ziri ezi n’iwu ka nwoke rapu nwunye-ya? nānwa Ya.

3 O we za, si ha, Gini ka Moses nyere unu n’iwu?

4 Ha we si, Moses kwere ka ede akwukwọ nkewa, ka arapu kwa ya.

5 Ma Jisus siri ha, N’ihi obi-etili-unu ka o dere unu iwu a n’akwukwọ.

6 Ma site na nmalite òkìkè uwa, Nwoke na nwanyi ka O mere ha.

7 N’ihi nka ka nwoke gēji rapu nna-ya na nne-ya, rapara n’aru nwunye-ya;

8 ha abua ewe ghọ otù anu-aru: ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru.

9 Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala.

10 N’ulo ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ajuju okwu a ọzọ.

11 O we si ha, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko megide ya:

12 ọ buru kwa na nwanyi onwe-ya arapu di-ya, luru kwa di ọzọ, ọ nākwa iko.

13 Ha we kutara Ya umu-ntakiri, ka O we metu ha aka: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba.

14 Ma mb͕e Jisus huru ya, iwe were Ya nke-uku, Ọ si ha, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem; unu eb͕ochila ha: n’ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a.

15 N’ezie asim unu, Onye ọ bula nke nāgaghi-anara ala-eze Chineke dika nwatakiri, ọ gaghi-abà nime ya ma-ọli.

16 O we kuru ha n’aka-Ya, bikwasi ha aka-Ya abua, we gọzie ha nke-ọma.

17 Mb͕e ọ nāpu n’uzọ, otù onye we b͕akuru Ya, b͕uru Ya ikperè, jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m’gēme ka m’we keta ndu ebighi-ebi?

18 Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke.

19 I matawo ihe nile enyere n’iwu, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Emeb͕ula madu, Sọpuru nna-gi na nne-gi.

20 Ma ọ siri Ya, Onye-ozizí, ihe ndia nile ka m’ribara ama site n’okorọbia.

21 Ma mb͕e Jisus lere ya anya Ọ hu ya n’anya, si ya, Otù ihe fọduru gi ime: laba, re ka ihe i nwere ra, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n’elu-igwe: bia kwa, som.

22 Ma iru-ya b͕aruru n’okwu a, o we la na nwuta: n’ihi na ọ bu onye nwere ihe ri nne.

23 Jisus we le anya buruburu, si ndi nēso uzọ-Ya, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n’ala-eze Chineke!

24 Ma ibobo okwu-Ya nile nwuru ndi nēso uzọ-Ya n’aru. Ma Jisus za-kwa-ra ọzọ, si ha, Umum, le otú ọ diri ha ike ibà n’ala-eze Chineke, bú ndi wereworo obi-ha tukwasi n’àkù!

25 Ọ dikariri camel nfé igabiga n’anya àgìgá, kari ọgaranya ibà n’ala-eze Chineke.

26 Ma ibobo nwubigara ha ókè n’aru, ha sirita onwe-ha, Onye kwa ka apuru izọputa?

27 Jisus lere ha anya, si, N’ebe madu nọ ọ bu ihe anāpughi íme, ma ọ bughi n’ebe Chineke nọ n’ihi na apuru ime ihe nile n’ebe Chineke nọ.

28 Pita malitere isi Ya, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile, ayi esowo kwa Gi.

29 Jisus siri, N’ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne-ndikom, ma-ọbu umu-nne-ndinyom, ma-ọbu nne, ma-ọbu nna, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n’ihim, na n’ihi ozi ọma nkem,

30 ma-ọbughi na ọ gānata ọgu ise ọgu ise ub͕u a n’oge a, ulo, na umu-nne-ndikom, na umu-nne-ndinyom, na nne, na umu, na ubi, ha na nsob͕u; ọ gānata kwa ndu ebighi-ebi n’oge nke nābia.

31 Ma ọtutu ndi bu uzọ gābu ndi-ikpe-azu; ndi-ikpe-azu gābu kwa ndi bu uzọ.

32 Ma ha nọ n’uzọ, nārigoro Jerusalem; Jisus we nāga n’iru ha: ibobo nwu-kwa-ra ha n’aru; ma ndi nēso Ya nātu egwu. O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya ọzọ, malite igwa ha ihe nile gaje ime Ya,

33 si, Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n’aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpe ọnwu, rara Ya nye n’aka ndi mba ọzọ:

34 ha gēme kwa Ya ihe-ọchi, busa Ya ọnu-miri, pia Ya ihe, b͕ue Ya: Ọ gēsi kwa n’ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.

35 Jemes na Jọn, bú umu Zebedi, we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, ayi nāchọ ka I mere ayi ihe ọ bula ayi gāriọ Gi.

36 O we si ha, Gini ka unu nāchọ ka M’mere unu?

37 Ha we si Ya, Me ayi ka ayi nọdu, otù n’aka-nri-Gi, otù n’aka-ekpe, n’ebube-Gi.

38 Ma Jisus siri ha, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem nāṅu? ma-ọbu ka eme unu baptism ahu dika anēme Mu onwem?

39 Ha we si Ya, Ayi puru. Jisus we si ha, Iko Mu onwem nāṅu ka unu gaṅu; baptism nke anēme Mu onwem ka agēme kwa unu:

40 ma inọdu n’aka-nrim ma-ọbu n’aka-ekpem abughi nkem inye: kama ọ diri ndi edoziworo ya.

41 Mb͕e ndi-ozi iri fọduru nuru ya iwe we malite iwe ha nke-uku n’ihi Jemes na Jọn.

42 Jisus we kpọ ha biakute Ya, si ha, Unu amatawo na ndi aguru ibu ndi-isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi uku ha nāchi kwa ha.

43 Ma ọ dighi otú a n’etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n’etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi:

44 ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n’etiti unu, ọ gabu orù unu nile.

45 N’ihi na Nwa nke madu Onwe-ya abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n’ọnọdu ọtutu madu.

46 Ha we bia rue Jeriko: mb͕e Ọ nāputa na Jeriko, Ya na ndi nēso uzọ-Ya na oké ìgwè madu, nwa-nwoke Timiọs, bú Bātimiọs, onye-aririọ kpuru ìsì, nānọdu n’akuku uzọ.

47 Mb͕e ọ nuru na ọ bu Jisus Onye Nazaret, o we malite íti nkpu, na isi, Nwa Devid, Jisus, merem ebere.

48 Ọtutu madu we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma o tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere.

49 Jisus we guzo, si, Kpọnu ya. Ha we kpọ onye-ìsì ahu, si ya, Nwe obi ike: bilie, Ọ nākpọ gi.

50 O we chifu uwe-ya, zọlie, biakute Jisus.

51 Jisus we za ya, si, Gini ka i nāchọ ka M’mere gi? Onye-ìsì ahu we si ya, Rabonai, ka eme ka m’hu uzọ.

52 Jisus we si ya, Laba; okwukwe-gi azọputawo gi. Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya n’uzọ.