Categories
MAIKA

MAIKA 1

1 Okwu Jehova nke ruru Maika, bú onye Moreshet, nti, n’ubọchi Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, bú okwu nke ọ huru bayere Sameria na Jerusalem.

2 Nurunu, unu ndi nile di iche iche, unu nile; ṅa nti, gi uwa, na ùjú-ya: ka Onye-nwe-ayi Jehova ghọ onye-àmà n’etiti unu, bú Onye-nwe-ayi site n’ulo uku Ya di nsọ.

3 N’ihi na, le, Jehova nēsi n’ebe-Ya puta, Ọ gāridata kwa, zọkwasi ebe di elu nile nke uwa ukwu.

4 Ugwu nile gāb͕aze kwa n’okpuru Ya, agāb͕awa kwa ndagwurugwu nile, dika wax n’iru ọku, dika miri nke anāwuda n’ebe-nrida.

5 N’ihi njehie Jekob ka ihe a nile di, na n’ihi nmehie nile nke ulo Israel. Gini bu njehie Jekob? ọ̀ bughi Sameria? gini bu kwa ebe di elu nile nke Juda? hà abughi Jerusalem?

6 M’gēme kwa Sameria ka ọ ghọ obo-ihe nke ọhia, ka ọ ghọ kwa ebe akuru ubi-vine: M’gāwusi kwa nkume-ya nile nime ndagwurugwu, ọ bu kwa ntọ-ala-ya nile ka M’gēkpughe.

7 Ọ bu kwa arusi-ya nile apiri api ka agētipia, ọ bu kwa onyinye ikwa-iko ya nile ka agēsure n’ọku, ọ bu kwa arusi-ya nile ka M’gēme ebe tọb͕ọrọ n’efu: n’ihi na o siworo n’onyinye nwanyi nke nākwa iko chikọta ha, ọ bu kwa rue onyinye nwanyi nākwa iko ka ha gālaghachi.

8 N’ihi nka ka m’gēti aka n’obi, kwasie ákwá ike, jegharia buru onye yipuworo uwe b͕a ọtọ: m’gēme ikwa-ákwá dika nkita-ọhia, na iru-újú dika enyi-nnunu.

9 N’ihi na ihe nādighi ngwọta ka ntiputa-ọnyá nile bu: n’ihi na ọ biaruwo Juda; o rutewo ọnu-uzọ-ama ndim, rue Jerusalem.

10 Unu egosila ya na Gat, unu akwala ákwá ma-ọli: nime Bet-le-afra ka m’turuworo onwem n’ájá.

11 Gabigara onwe-unu, gi nwanyi bi na Shafia, n’ọtọ na ihere: nwanyi bi na Zeanan aputaghi; otiti-aka-n’obi nke Bet-izel gānapu unu ebe-nguzo-ya.

12 N’ihi na nwanyi bi na Marot echerewo inwe ezi ihe: n’ihi na ihe ọjọ esiwo n’ebe Jehova nọ ridarue ọnu-uzọ-ama Jerusalem.

13 Kegide ub͕ọ-ala n’inyinya ukwu ọsọ, gi nwanyi bi na Lekish: isi-nmalite nmehie ka ọ buru ada Zaion; n’ihi na ọ bu nime gi ka ahuru njehie nile nke Israel.

14 N’ihi nka ka i gēnye Moreshet-gat ihe-idu-ulo di iche iche: ulo nile nke Akzib gāghọrọ ndi-eze Israel miri-iyi nārafu arafu.

15 Ọzọ, onye-nnweta ka M’gēme ka ọ biakute gi, gi nwanyi bi na Maresha: rue Adulam ka nsọpuru Israel gābia.

16 Mere onwe-gi isi-nkwọcha, kọpu isi-gi n’ihi umu nke ihe-utọ-gi nile: me ka isi-nkwọcha-gi sa mbara dika nke udele; n’ihi na emewo ka ha si n’ebe i nọ je biri n’ala ọzọ.

Categories
MAIKA

MAIKA 2

1 Ahuhu diri ndi nēchèputa ajọ ihe, nālu kwa ihe ọjọ n’elu ihe-ndina-ha! n’ìhè nke ututu ka ha nēme ya, n’ihi na ọ di n’ike aka-ha.

2 Ha we tukwasi anya-uku n’ubi, nara ha n’ike; ha tukwasi anya-uku n’ulo, būru ha: ha emeb͕uwo kwa ma nwoke ma ulo-ya, bú onye ọ bula na ala-nketa-ya.

3 N’ihi nka ka Jehova siri otú a: Le, M’nēchè èchìchè ihe ọjọ megide ab͕uru nka, bú ihe ọjọ nke unu nāgaghi-ekopu olu-unu, unu agaghi-ejeghari kwa n’idi-elu; n’ihi na mb͕e ọjọ ka ọ bu.

4 N’ubọchi ahu ka agātu ilu megide unu, gosie ákwá ike, si: Apunarisiwo ayi ihe: òkè ndim ka Ọ nāb͕anwe: le ka O si ewepurum ya nke-uku! ọ bu onye nke nādaghachi azu ka Ọ nēkère ubi nile ayi.

5 N’ihi nka i gaghi-enwe onye nātu eriri-ọtùtù n’ala ruru madu n’ife-nzà nime nkpọkọta ndi Jehova.

6 Unu abusala okwu dika miri, otú a ka ha nābusa okwu. Ha agaghi-abusará ndia okwu: okwu-ha nke nētiye n’ọnọdu-ihere agaghi-ewezuga onwe-ha.

7 Gi ulo Jekob, àgāsi, Mọ nke Jehova, Ọ̀ rapuru ibu onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ? ihe ndia, hà bu omume-Ya? okwum nile, hà adighi-eme onye nējeghari n’ezi nma?

8 Ma nnyahuru ka ndim nēbili ọtọ ibu onye-iro: ọ bu n’uwe-nb͕okwasi ka unu nēyipucha uwe-nwuda n’aru ndi nāgabiga na ntukwasi-obi, bú ndi si n’agha echighari.

9 Ndinyom nke ndim ka unu nāchupu n’ulo ihe-utọ nile ha; umu-ntakiri-ha ka unu nānapu ebubem rue mb͕e ebighi-ebi.

10 Bilienu, la; n’ihi na nka abughi izu-ike-unu: n’ihi iru-árú nke nemebi emebi, ọbuná nmebi di irè.

11 Ọ buru na onye ọ bula nke nējeghari n’ifufe na okwu-ugha ekwu okwu-ugha, si, M’gābusara gi okwu dika miri bayere manya-vine, baye-kwa-ra ihe-ọṅuṅu nāba n’anya; ọ gābu kwa onye nābusara ndi nka okwu dika miri.

12 Gi Jekob, aghaghm ime ka ndi-gi nile zukọta; aghaghm ichikọta ndi Israel fọduru; n’otù ka M’gēdokọ ha dika ìgwè ewu na aturu nke Bọzra: dika ìgwè aturu n’etiti ebe-ita-nri-ya; ha gēme oké nkpọtu n’ihi uba madu.

13 Onye-ntipú ahu arigowo n’iru ha: ha etipúwo, we gabiga rue ọnu-uzọ-ama, pua na ya: eze-ha agabigawo kwa n’iru ha, Jehova kwa n’isi ha.

Categories
MAIKA

MAIKA 3

1 M’we si, Biko, nurunu, unu ndi-isi Jekob, na unu ndi-ikpe ulo Israel: ọ̀ bughi ihe diri unu, bú imara ikpé?

2 unu ndi nākpọ ezi ihe asì, ndi nāhu kwa ihe ọjọ n’anya; ndi nādọwapu ha akpukpọ n’aru, na anu-aru-ha n’ọkpukpu nile ha;

3 ndi nēri kwa anu-aru ndim; ọ bu kwa akpukpọ-aru-ha ka ha b͕aworo ha, ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ha b͕ajisiworo: e, ha eb͕ubisiwo ha dika ihe agēsi n’ite, na dika anu n’etiti ite ọla.

4 Mb͕e ahu ka ha gētiku Jehova nkpu, ma Ọ gaghi-aza ha: Ọ gēzonari kwa ha iru-Ya na mb͕e ahu, dika ha meworo ka omume nile ha jọ njọ.

5 Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere ndi-amuma ahu ndi nēdufu ndim; ndi ji ezé-ha ata aru, we kpọ, si, Udo; ma onye ọ bula nke nādighi-etiye ihe n’ọnu-ha, ha ewe do agha nsọ megide ya;

6 N’ihi nka ka abali gādiri unu, unu ewe ghara ihu ọhù; ọchichiri gāb͕a-kwa-ra unu, unu ewe ghara iju ase; anyanwu gādakpute kwa ndi-amuma ahu, ubọchi ewe ji nji n’elu ha.

7 Ihere gēme kwa ndi-ọhù, ndi nāju ase gēnwe kwa iru-ihere; e, ha gēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-ha, ha nile: n’ihi na ọ dighi ọziza Chineke nāza.

8 Ma otú ọ di mu onwem juputara n’ike, bú Mọ nke Jehova, na ikpé, na idi-ike, igosi Jekob njehie-ya, na igosi Israel nmehie-ya.

9 Biko, nurunu nka, unu ndi-isi ulo Jekob, na unu ndi-ikpe ulo Israel, ndi nākpọ ikpé ziri ezi ihe-árú, ọ bu kwa izi-ezi nile ka ha nēme ka ọ b͕agọrọ ab͕agọ.

10 Ndi ji ọbara èwu Zaion, ji kwa ajọ omume ewu Jerusalem.

11 Ndi-isi-ya nēkpe ikpe n’ihi iri-ngo, ndi-nchu-àjà-ya nēzí ihe n’ihi ugwọ, ndi-amuma-ya nāju ase n’ihi ego: ma na Jehova ka ha nādabere, si, Jehova, Ọ̀ nọghi n’etiti ayi? ihe ọjọ agaghi-abiakwasi ayi.

12 N’ihi nka ka agēji plough gwu Zaion dika ubi n’ihi unu, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.

Categories
MAIKA

MAIKA 4

1 Ọ gēru kwa, n’ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n’elu ugwu nile, agēbuli kwa ugwu ahu elu kari ugwu ntà nile; ndi di iche iche gērùbà nime ya dika osimiri.

2 Ọtutu mba gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu Jehova, ru kwa ulo Chineke nke Jekob; Ọ gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n’okporo-uzọ-Ya nile: n’ihi na Zaion ka iwu gēsi puta, okwu Jehova gēsi kwa na Jerusalem puta.

3 Ọ gēkpe kwa ikpe n’etiti ọtutu ndi di iche iche, dozi-kwa-ra mba di iche iche nwere ume okwu-ha rue ebe di anya; ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.

4 Ma ha gēbi, onye ọ bula n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dighi kwa onye gēme ka ha ma jijiji: n’ihi na ọnu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ekwuwo okwu.

5 N’ihi na ndi nile di iche iche nējeghari, onye ọ bula n’aha nke chi-ya; ayi onwe-ayi ganējeghari kwa n’aha Jehova, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6 N’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ka M’gēme ka nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi zukọta, ọ bu kwa nwanyi ahu nke achupuru achupu ka M’gāchikọta, ya na nwanyi nke M’meworo ihe ọjọ;

7 M’gēme kwa ka nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi ghọ ndi fọduru afọdu, M’gēme kwa ka nwanyi ahu nke emere ka ọ nọ n’ebe di anya ghọ mba nwere ume: Jehova gābu kwa eze-ha n’ugwu Zaion site n’ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

8 Ma gi onwe-gi, ulo-elu nke ìgwè aturu, Ofel nke ada Zaion, gi ka ọ gābiakute; e, ọchichi anāchi mbu gābia, bú ala-eze nke diri ada Jerusalem.

9 Ub͕u a n’ihi gini ka i nētisi nkpu ike? Ọ̀ bu na eze adighi na gi? onye-ndum-ọdu-gi, ọ lawo n’iyì, na ihe-nb͕ali ejidewo gi dika nke nwanyi ime nēme?

10 Nāb͕ali, Jisie ike imuputa nwa, gi ada Zaion, dika nwanyi ime nēme: n’ihi na ub͕u a ka i gāpu n’obodo, biri n’ọhia, biarue Babilon; n’ebe ahu ka agānaputa gi; n’ebe ahu ka Jehova gāb͕aputa gi n’aka ndi-iro-gi.

11 Ma ub͕u a ọtutu mba achikọtawo onwe-ha imegide gi, ndi nāsi, Ka emerua ya, ka anya-ayi lekwasi kwa Zaion.

12 Ma ndi ahu amaghi èchìchè nile nke Jehova, ha aghọtaghi kwa ndum-ọdu-Ya: n’ihi na Ọ chikọtawo ha dika ùkwù-ọka n’ebe-nzọcha-ọka.

13 Bilie, zọcha, gi ada Zaion: n’ihi na mpi-gi ka M’gēme ka ọ ghọ ígwè, ọ bu kwa ukwu-gi ka M’gēme ka ha ghọ ọla: i gāzọpia kwa ọtutu ndi di iche iche: M’gēwezuga kwa urù-ha nye Jehova, wezuga kwa àkù-ha nye Onye-nwe uwa nka nile.

Categories
MAIKA

MAIKA 5

1 Ub͕u a ka i gēdo onwe-gi n’usu ndi nāpunara madu ihe, gi ada nke usu ndi nāpunara madu ihe: nnọchigide-n’agha ka ọ nọchigideworo ayi: ha gēji nkpa-n’aka tie onye-ikpe Israel na ǹtì.

2 Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n’etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n’Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n’ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.

3 N’ihi nka ka Ọ gārara ha nye, rue mb͕e nwanyi ime nēme gāmuwori nwa: umu-nne-ya ndi fọduru afọdu ewe laghachikute umu Israel.

4 Ọ gēguzo kwa, zùa ìgwè aturu-ya n’ike nke Jehova, na nbili-elu nke aha Jehova, bú Chineke-ya: ha gēbiri kwa; n’ihi na ub͕u a ka ọ gādi uku rue nsọtu nile nke uwa.

5 Onye a gābu kwa udo: mb͕e Asiria gābata n’ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n’ulo-elu nile ayi, ayi gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu asa na ndi-isi madu asatọ bilie imegide ya.

6 Ha gēji kwa mma-agha b͕uchapu ala Asiria na ala Nimrod n’ọnu-uzọ-ya nile: ọ gānaputa kwa ayi n’aka Asiria, mb͕e ọ gābata n’ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n’ókè-ala-ayi.

7 Ndi Jekob fọduru gādi kwa n’etiti ọtutu ndi di iche iche dika igirigi sitere n’ebe Jehova nọ, dika aburubu-miri n’elu ihe-ọkukú; nke nādighi-ele anya onye ọ bula, nke nādighi-echere kwa umu madu.

8 Ndi Jekob fọduru gādi kwa n’etiti mba nile, n’etiti ọtutu ndi di iche iche, dika ọdum n’etiti anumanu nke oké ọhia, dika nwa-ọdum n’etiti ìgwè ewu na aturu nile: nke gābu, mb͕e ọ gāgabiga, ọ gāzọda, dọkasia, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.

9 Ka aka-gi di elu imegide ndi nākpab͕u gi, ka ebipu kwa ndi-iro-gi nile.

10 Ọ gēru kwa n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na M’gēbipu inyinya-gi nile n’etiti gi, me ka ub͕ọ-ala-gi nile la n’iyì:

11 M’gēbipu kwa obodo nile nke ala-gi, kwatue ebe-gi nile ewusiri ike:

12 M’gēbipu kwa n’aka-gi mb͕asi nile; i gaghi-enwe kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ:

13 M’gēbipu kwa arusi-gi nile apiri api na ogidi-gi nile n’etiti gi; i gaghi-akpọ kwa isi ala nye ọlu aka-gi ọzọ.

14 M’gēropu kwa Asherim-i n’etiti gi: M’gēkpochapu kwa ndi-iro-gi nile.

15 M’gābọ̀ kwa ọ́bọ̀ n’iwe na n’ọnuma n’aru mba nile ndi nānughi olum.

Categories
MAIKA

MAIKA 6

1 Biko, nurunu ihe Jehova nāsi: Bilie, je ikpe n’iru ugwu nile, ka ugwu ntà nile nu kwa olu-gi.

2 Unu ugwu, nurunu okwu ikpe Jehova; nu-kwa-nu, unu ntọ-ala uwa nke nādigide mb͕e nile: n’ihi na Jehova na ndi-Ya nēkperita ikpe, ọ bu kwa Israel ka Ọ gāruso uka.

3 Ndim, gini ka M’meworo gi? ọ̀ bu kwa gini ka M’jiworo me ka ike gwu gi? b͕a àmà megidem.

4 N’ihi na M’mere ka i si n’ala Ijipt rigoputa, ọ bu kwa n’ulo ndi-orù ka M’b͕aputara gi; M’we ziga Moses na Eron na Miriam iga n’iru gi.

5 Ndim, biko, cheta ihe Belak, bú eze Moab, b͕ara n’ìzù, na ihe Belam nwa Beoa zara ya; cheta site na Shitim rue Gilgal, ka unu we mara ezi omume nile nke Jehova.

6 M’gēji gini bia n’iru Jehova, rube isi n’iru Chineke di elu? #m’gābia n’iru Ya chiri ihe àjà-nsure-ọku, chiri umu-ehi b͕ara otù arọ?

7 Ọ̀ gātọ Jehova utọ, bú nnù kwuru nnù ebulu ma-ọbu orú nnù kwuru orú nnù iyi manu? #m’gēnye ọkparam n’ihi njehiem, nkpuru afọm n’ihi nmehie nkpuru-obim?

8 Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ̀ bu kwa gini ka Jehova nāchọ n’aka-gi, ma-ọbughi nání ime ihe ekpere n’ikpe, na ihu ebere n’anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije?

9 Olu Jehova nākpọ obodo òkù, onye-nzube-ihe gāhu kwa aha-Gi: nurunu nkpa-n’aka, na Onye kaworo ya.

10 Ọ̀ di àkù nmebi-iwu fọduru n’ulo onye-nmebi-iwu, ma-ọbu ephah nērughi eru nke nākpasu Chineke oké iwe?

11 M’gādi ọcha n’obi mb͕e m’nwere ihe-ọtùtù nmebi-iwu, mb͕e m’nwe-kwa-ra akpa nkume-ọtùtù aghughọ?

12 N’ihi na ndi-ọgaranya-ya juputara n’ihe-ike, ndi bi nime ya ekwuwo kwa okwu-ugha, ire-ha di kwa aghughọ n’ọnu-ha.

13 Ọzọ kwa, Mu onwem etiputawom i ọnyá jọb͕uru onwe-ya; emewom i ka i tọb͕ọrọ n’efu n’ihi nmehie-gi nile.

14 Gi onwe-gi gēri ihe, ma afọ agaghi-eju gi; afọ-awọrọ-gi gādigide kwa nime gi: i gēwezuga kwa ndi-gi, ma i gaghi-eme ka ha b͕apu; ma ndi i nēme ka ha b͕apu, ọ bu mma-agha ka M’gēwere ha nye.

15 Gi onwe-gi gāgha nkpuru, ma i gaghi-ewe ihe-ubi: gi onwe-gi gāzọcha nkpuru osisi olive, ma i gaghi-ete manu n’aru gi; i gāzọchapu kwa manya-vine ọhu, ma i gaghi-aṅu manya-vine.

16 N’ihi na anēdebe ukpuru nile nke Ọmri, na ọlu nile nke ulo Ehab, unu ewe jeghari nime ndum-ọdu nile ha: ka M’we me gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, me kwa ndi bi nime-ya ka ha ghọ ihe-ima-ọsọ; ọ bu kwa ita-uta ndim ka unu gēbu.

Categories
MAIKA

MAIKA 7

1 Ahuhu dirim! n’ihi na Adiwom ka mb͕e ha ghọkọtaworo nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru, dika ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke ọghughọ-nkpuru-vine: ọ dighi otù uyọkọ nkpuru-vine fọduru iri; nkpuru-osisi fig nke buru uzọ cha ka nkpuru-obim chọsiworo ike.

2 Onye-ebere alawo n’iyì pua n’uwa, ọ dighi kwa onye ziri ezi n’etiti madu: ha nile nēche anwu ọbara; ha ji ub͕u achu ntá, onye ọ bula nwa-nne-ya.

3 Ọ bu n’elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n’ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n’iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.

4 Onye nke ha nke kachasi nma di ka uke: onye ziri ezi jọrọ njọ kari ogige ogwu: ubọchi ndi-nche-gi, bú nleta-gi, abiawo; ub͕u a ka mb͕e ib͕a ha ghari gādi.

5 Unu ekwerela n’eyì, unu atukwasila eyì unu mara nke-ọma obi: debe eb͕ub͕ere-ọnu-gi ghara igwa nwanyi nēdina n’obi-gi okwu.

6 N’ihi na nwa-nwoke nākpọ nna-ya onye-nzuzu, nwa-nwanyi nēbili imegide nne-ya, nwunye nwa imegide nne di-ya; ndi-iro madu bu ndi ulo-ya.

7 Ma mu onwem, nime Jehova ka m’gēche nche nke-ọma; M’gēchere Chineke nke nzọputam: Chinekem gānu olum.

8 Aṅulam ọṅu, gi onye-irom: mb͕e m’dara ada, m’bilie; mb͕e m’nānọdu n’ọchichiri, Jehova gāburum ìhè.

9 Iwe di ọku nke Jehova ka m’gēbu, n’ihi na emehiewom megide Ya; rue mb͕e Ọ gēkpe ọnum, me ihe ekpere n’ikpem, Ọ gēme ka m’puta n’ìhè, m’gēlekwasi kwa ezi omume-Ya anya.

10 Nwanyi-irom gāhu kwa ya, ihere ewe kpuchie ya iru; bú onye nāsim, Òle ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ? Anyam abua gēlekwasi ya; ub͕u a ka ọ gāghọ ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.

11 Ubọchi ib͕a ogige-gi nile gādi! n’ubọchi ahu ka ókè-gi gādi n’ebe di anya.

12 N’ubọchi ahu ọ bu kwa gi ka agābiakute, site n’Asiria na obodo nile nke Ijipt, site kwa n’Ijipt we rue Osimiri, site kwa n’oké osimiri rue oké osimiri, site kwa n’ugwu rue ugwu.

13 Ma ala nka gāghọ, ebe tọb͕ọrọ n’efu n’ihi ndi bi nime ya, site na nkpuru nke omume nile ha.

14 Were nkpa-n’aka-Gi zùa ndi-Gi, bú ìgwè ewu na aturu nke ihe-nketa-Gi, ndi bi iche, n’oké ọhia n’etiti Kamel: ka ha ta nri nime Beshan na Gilead, dika n’ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.

15 Dika n’ubọchi i siri n’ala Ijipt puta, otú a ka M’gēme ka ọ hu oké ọlu di iche iche.

16 Mba di iche iche gāhu ya, ihere idi-ike-ha ewe me ha: ha gātukwasi aka n’ọnu, nti-ha gēchi.

17 Ha gāracha ájá dika agwọ; dika ihe di iche iche nke nākpu akpu nke ala, otú a ka ha gēwere ima-jijiji si n’ebe-nmechibido nile ha puta: Jehova, bú Chineke-ayi, ka ha gābiakute n’oké egwu, ha gātu kwa egwu gi.

18 Ònye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru? O jigideghi iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, n’ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu.

19 Ọ gēchighari, nwe obi-ebere n’aru ayi; Ọ gāzọda ajọ omume nile ayi: I gātubà kwa nmehie nile ha n’ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri.

20 I gēnye Jekob ezi-okwu, me-kwa-ra Abraham ebere, bú nke I ṅuworo nna-ayi-hà n’iyi site n’ubọchi nile nke mb͕e ochie.