Categories
LUK

LUK 21

1 O we le anya n’elu, hu ndi-ọgaranya ka ha nātubà onyinye-ha n’ebe anēdebe ùtú anātu.

2 O we hu otù nwayi, bú ob͕eye, nke di-ya nwuru, ka ọ nātubà n’ebe ahu ego ntà abua.

3 O we si, N’ezie asim unu, Nwanyi a, bú ob͕eye, nke di-ya nwuru, ọ tubàra kari ha nile:

4 n’ihi na ndia nile sitere n’inwebiga-àkù-ókè-ha tubà n’onyinye: ma nwanyi ahu sitere n’ukọ-ya tubà ihe nile o nwere nke o ji biri.

5 Mb͕e ufọdu nēkwu okwu bayere ulo uku Chineke, na ewereri nkume ọma na ihe enyere Chineke dozie ya, O we si,

6 Ihe ndia nke unu nēkiri, ubọchi gābia, nke anāgaghi-arapu otù nkume n’ebe a n’elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n’ala.

7 Ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, òle mb͕e ihe ndia gābu kwa? gini gābu kwa ihe-iriba-ama mb͕e ọ bula ihe ndia gaje ime?

8 O we si, Lezienu anya ka aghara iduhie unu; n’ihi na ọtutu madu gābia n’aham, si, Mu onwem bu Ya; na, Oge ahu di nso: unu esola ha n’azu.

9 Ma mb͕e ọ bula unu gānu okwu agha di iche iche na aghara di iche iche, unu atula ujọ: n’ihi na ihe ndia aghaghi ibu uzọ puta; ma ọgwugwu ihe nile adighi-eru ngwa ngwa.

10 Mb͕e ahu Ọ siri ha, Mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ:

11 oké ala-ọma-jijiji gādi kwa, oké unwu na ajọ ọria nēfe efe gādi kwa n’ebe di iche iche; ihe di egwu na ihe-iriba-ama uku gādi kwa site n’elu-igwe.

12 Ma mb͕e ihe ndia nile akēmeghi, ha gātukwasi unu aka-ha, sob͕u kwa unu, nārara unu nye n’aka ulo-nzukọ na ulo-nkpọrọ, n’ebe anēduputa unu ga n’iru ndi-eze na ndi-isi n’ihi aham.

13 Ọ gāghọrọ unu àmà.

14 Ya mere, zubenu n’obi-unu, na unu agaghi-ebu uzọ tughari uche otú unu gāgọpu onwe-unu:

15 n’ihi na Mu onwem gēnye unu ọnu na amam-ihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgaghi-apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu.

16 Ma ọbuná ndi muru unu, na umu-nne-unu, na ndi-ikwu-unu, na ndi-eyì-unu, gārara unu nye; ha gēme kwa ka ufọdu nime unu nwua ọnwu.

17 Madu nile gakpọ kwa unu asì n’ihi aham.

18 Ma otù agiri-isi agaghi-esi n’isi-unu la n’iyì ma-ọli.

19 Na ntachi-obi-unu unu gānata nkpuru-obi-unu.

20 Ma mb͕e ọ bula unu gāhu Jerusalem ka achi usu-ndi-agha nọgide ya gburugburu, mb͕e ahu maranu na itọb͕ọrọ-n’efu-ya di nso.

21 Mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n’ugwu; ndi nọ kwa n’etiti ya, ka ha si nime ya wezuga onwe-ha; ndi nọ kwa n’ala ọzọ, ka ha ghara ibà nime ya.

22 N’ihi na ndia bu ubọchi nkpeputa, ka ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ we mezu.

23 Ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu; n’ihi na oké nkpà gādi n’ala nka, iwe gādi-kwa-ra ndi-Ju.

24 Ha gāda kwa site n’ọnu mma-agha, agādọta kwa ha n’agha ga na mba nile: ndi mba ọzọ gāzọda Jerusalem n’ala, rue mb͕e oge nke mba ọzọ gēmezu.

25 Ihe-iriba-ama di iche iche gādi kwa n’anyanwu na ọnwa na kpakpando; n’elu uwa ka nkpab͕u nke mba di iche iche gādi kwa, ndi nọ n’obi abua n’ihi nbib͕o nke oké osimiri na ebili-miri;

26 madu nātub͕ọ site n’egwu, site kwa na ile-anya ihe nābiakwasi n’elu-uwa dum madu bi: n’ihi na agēme ka ike nile nke elu-igwe me nkpatu.

27 Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n’igwe-oji, Ya na ike na oké ebube.

28 Ma mb͕e ihe ndia malitere ime, lenu anya n’elu, welikwanu isi-unu; n’ihi na nb͕aputa-unu nēru nso.

29 O we turu ha ilu: Lenu osisi fig, na osisi nile:

30 mb͕e ọ bula ha púru epú ub͕u a, unu huru ya mara kwa n’onwe-unu na mb͕e okpom-ọku di nso ub͕u a.

31 Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia ka ha nāputa, maranu na ala-eze Chineke di nso.

32 N’ezie asim unu, Ọbọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe nile gēme.

33 Elu-igwe na uwa gāgabiga: ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.

34 Ma nēzenu onwe-unu, ka aghara iwere imebiga-ajọ-ihe-ókè, na iṅubiga-manya-ókè, na ncheb͕u nke ndu a, bob͕u obi-unu ma eleghi anya, ubọchi ahu we biakwasi unu na mberede dika ọnyà;

35 n’ihi na otù a ka ọ gābiakwasi ndi nile bi n’elu uwa nile.

36 Ma murunu anya n’oge ọ bula, nāriọ aririọ, ka unu we nwe ike ib͕anari ihe nile ndia nke gaje ime, na iguzo n’iru Nwa nke madu.

37 Kwa-ubọchi O nēzí ihe n’ulo uku Chineke; kwa-abali Ọ nāpu, nānọ ọnọdu-abali n’ugwu anākpọ ugwu Olive.

38 Ndi-Ju nile nābiakute kwa Ya n’isi-ututu n’ulo uku Chineke, inu okwu-Ya.

Categories
LUK

LUK 22

1 Ma ememe achicha ekoghi-eko, nke anakpọ Ngabiga, nēru nso.

2 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi b͕u Ya; n’ihi na ha nātu egwu ndi-Ju.

3 Setan we ba nime Judas onye anakpọ Iskariot, onye di n’ọnu-ọgugu ndi-ozi iri na abua ahu.

4 O we je, ya na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ọchi-agha we kparia, otú ọ gēsi rara Ya nye n’aka-ha.

5 Ha we ṅuria ọṅu, we kwekọ inye ya ego.

6 O we kwere, we nāchọ oghere irara Ya nye n’aka-ha mb͕e ìgwè madu nānọghi.

7 Ma ubọchi achicha ekoghi-eko biara, nke anāghaghi ichu àjà ngabiga.

8 O we zipu Pita na Jọn, si, Ganu, doziere ayi oriri ngabiga, ka ayi we rie.

9 Ha we si Ya, Òle ebe I nācho ka ayi dozie?

10 Ọ si ha, Le, mb͕e unu batasiri nime obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute unu; sonu ya ba n’ulo nke ọ nābà nime ya.

11 Unu gāsi kwa nna-nwe ulo ahu, Onye-ozizí si gi, Òle ebe ulo-ọbìa di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga?

12 Onye ahu gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n’elu ulo akwadebeworo: dozienu n’ebe ahu.

13 Ha we je, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga.

14 Mb͕e oge hour ahu ruru, O we nọdu na nri, Ya na ndi-ozi-Ya.

15 O we si ha, Agu gusirim ike iso unu ri oriri ngabiga nka mb͕e Mu akāhughi ahuhu:

16 n’ihi na asim unu, M’gaghi-eri ya ma-ọli, rue mb͕e ọ gēmezu n’ala-eze Chineke.

17 O we nara iko, kele kwa, we si, Naranu nka, kè kwa ya n’etiti onwe-unu:

18 n’ihi na asim unu, M’gaghi-aṅu ihe si n’osisi vine puta ma-ọli site ugbu a, rue mb͕e ala-eze Chineke gābia.

19 O we nara ob͕e achicha, kele kwa, we nyawa ya, nye ha, si, Nka bu arum nke anēnye n’ihi unu: nēmenu nka ka anu we nēchetam.

20 Mb͕e ha risiri nri-anyasi Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram, bú nke anāwusi n’ihi unu.

21 Ma le, aka onye nāraram nye diyerem n’elu table.

22 N’ihi na Nwa nke madu nāga n’ezie, dika akaworo ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n’aka-ya rara Ya nye.

23 Ha we malite ijurita onwe-ha, onye ọ bu n’etiti ha gēme ihe a.

24 Esem-okwu we da kwa n’etiti ha, onye nime ha ka anāgu na ọ ka ibe-ya uku.

25 O we si ha, Ndi-eze nke mba ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi nāchi kwa ha ka anākpọ ndi nālu ọlu ọma.

26 Ma unu onwe-unu agaghi-adi otú a: kama onye ka ibe-ya uku n’etiti unu, ya di ka onye bu nwata; onye bu kwa onye-isi, ya di ka onye nēje ozi.

27 N’ihi na ònye ka ibe-ya uku, onye nānọdu na nri, ma-ọbu onye nēje ozi? ọ̀ bughi onye nānọdu na nri? ma Mu onwem di n’etiti unu ka onye nēje ozi.

28 Ma unu onwe-unu bu ndi soworom n’ọnwunwam nile;

29 Mu onwem nāb͕a kwa ndu inye unu ala-eze, dika Nnam b͕ara ndu inyem,

30 ka unu we rie ṅu kwa na table nkem n’ala-ezem; unu gānọkwasi kwa n’oche-eze nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé.

31 Saimon, Saimon, le, Setan riọtara unu, ka ọ yọcha unu dika ọka:

32 ma Mu onwem riọrọ aririọ bayere gi, ka okwukwe-gi ghara igwu agwu: gi-onwe-gi, mb͕e i gēchighariwori, gi me kwa ka umu-nna-gi guzosie ike.

33 O we si Ya, Onye-nwe-ayi, abum onye edoziworo iso Gi ga rue ulo-nkpọrọ ru kwa ọnwu.

34 O we si, Asim i, Pita, oke-ọkuku agaghi-akwá ta, rue mb͕e i gāgọ ub͕ò atọ, si na i mataghim.

35 O we si ha, Mb͕e M’zipuru unu nējighi àkpà-ego, na àkpà-ije, na akpukpọ-ukwu, ọ̀ di ihe kọrọ unu? Ha si, Ọ dighi ihe kọrọ ayi.

36 O we si ha, Ma ub͕u a, onye nwere àkpà-ego, ya were ya, onye nwere àkpà-ije, ya were kwa ya: ma onye nēnweghi, ya re uwe-ya, zuta mma-agha.

37 N’ihi na asim unu, na ihe a edeworo n’akwukwọ nsọ aghaghi imezu n’arum, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya: n’ihi na ihe dirim nwere ọgwugwu.

38 Ha we si, Onye-nwe-ayi, le, mma-agha abua di n’ebe a. O we si ha, O zuwo.

39 O we puta, ga ugwu Olive, dika Ọ nēme mb͕e dum; ndi nēso uzọ-Ya soro kwa Ya.

40 Ma mb͕e O ruru n’ebe ahu, Ọ siri ha, Nēkpenu ekpere ka unu ghara ibà n’ọnwunwa.

41 Ewe weputa Ya onwe-ya n’etiti ha dika ebe agāturu nkume; O we b͕ue ikperè n’ala we nēkpe ekpere,

42 si, Nna, ọ buru na ọ di Gi nma, naram iko a: otú ọ di, ka eme ihe Gi onwe-gi nāchọ, ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ.

43 Ewe me ka Ọ hu mọ-ozi nke si n’elu-igwe bia, nēnye Ya ike.

44 Ma ebe o nēb͕u Ya nb͕u n’obi ri nne Ọ kpe ekpere si-ike karia: ọsusọ-Ya we ghọ ihe dika oké ọkpurukpu ọbara nāda n’ala.

45 Mb͕e O biliri n’ekpere-Ya, O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura site n’ihe-nwuta,

46 O we si ha, Gini mere unu nāraru ura? bilienu nēkpe kwa ekpere, ka unu we ghara ibà n’ọnwunwa.

47 Mb͕e Ọ kpu okwu n’ọnu, le, ìgwè madu biara; onye ahu anākpọ Judas, bú otù onye n’etiti ndi-ozi iri na abua ahu, buru kwa ha uzọ nābia; o we bia rue Jisus nso isutu Ya ọnu.

48 Ma Jisus siri ya, Judas, ì ji isutu-ọnu nārara Nwa nke madu nye?

49 Ma mb͕e ndi nọ Ya gburugburu huru ihe gādi, ha si, Onye-nwe-ayi, àyi gēwere mma-agha b͕ue?

50 Otù onye nime ha we b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya.

51 Ma Jisus zara, si, Kwenu ya rue nka. O we metu nti-ya aka, me ka aru di ya ike.

52 Jisus we si ndi-isi-nchu-àjà, na ndi-ọchi-agha nke ulo uku Chineke, na ndi-okenye, ndi biara imegide Ya, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi, dika imegide onye nāpunara madu ihe?

53 Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n’ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri.

54 Ha we jide Ya, duru Ya je, dubà kwa Ya n’ulo onye-isi-nchu-àjà. Ma Pita nēso n’ebe di anya.

55 Ma mb͕e ha funwuru ọku n’etiti obí, we nọdu ala n’otù, Pita we nọdu n’etiti ha.

56 Ma otù nwa-ab͕ọghọ huru ya ka ọ nọduru n’ìhè ọku ahu, o we legide ya anya, si, Nwoke a na Ya nọ-kwa-ra.

57 Ma ọ gọrọ, si, Nwanyi amataghim Ya.

58 Mb͕e nwa oge gasiri onye ọzọ we hu ya, si, Gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha. Ma Pita siri, Nwoke, abughim.

59 Ma mb͕e ihe dika otù oge hour gasiri onye ọzọ kwusibere ike, si, N’ezie nwoke a na Ya nọkwara: n’ihi na ọ bu kwa onye Galili.

60 Ma Pita siri, Nwoke, amataghim ihe i nēkwu. Ngwa ngwa, mb͕e ọ kpu okwu n’ọnu, oke-ọkuku we kwa ákwá.

61 Onye-nwe-ayi we chigharia, le Pita anya. Pita we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ta, i gāgọnarim ub͕ò atọ.

62 O we pua, kwa ákwá nke-uku.

63 Ndikom ndi jidere Jisus we me Ya ihe-ọchì, pia kwa Ya ihe.

64 Ha we kechi iru-Ya, jua Ya, si, Bue amuma: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka?

65 Ọtutu ihe ọzọ ka ha kwuru megide Ya, nēkwulu Ya.

66 Mb͕e chi bọrọ, nb͕akọ ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ, ma ndi-isi-nchu-àjà ma ndi-ode-akwukwọ; ha we duru Ya ga ba na nnọkọ-ikpé-ha, si,

67 Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist, gwa ayi. Ma Ọ siri ha, Ọ buru na Mu agwa unu, unu agaghi-ekwe ma-ọli:

68 ma ọ buru na Mu aju unu ajuju, unu agaghi-aza ma-ọli.

69 Ma site n’ub͕u a ka Nwa nke madu gānọdu n’aka-nri nke ike Chineke.

70 Ha nile si, Gì onwe-gi bu kwa Ọkpara Chineke? Ọ si ha, Unu onwe-unu si na Mu onwem bu Ya.

71 Ha we si, Ọ̀ bu nkpà àmà gini nākpa ayi ọzọ? n’ihi na ayi onwe-ayi nuru site n’ọnu-Ya.

Categories
LUK

LUK 23

1 Ọra ndi ahu nile we bilie, duru Ya je n’iru Pailat.

2 Ha we malite ibo Ya ebubo, si, Ayi huru Onye a, ka O nēduhie mba-ayi, nēb͕ochi ha itu ùtú nye Sisa, nāsi kwa na Ya onwe-ya bu Kraist, buru kwa Eze.

3 Pailat we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu eze ndi-Ju? O we za ya, si, Gi onwe-gi kwuru.

4 Pailat we si ndi-isi-nchu-àjà na ìgwè madu nile, Ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie n’aru Nwoke a.

5 Ma ha kwusiri ike kari, si, Ọ nākwali ndi-Ju, nēzí ihe n’ebe nile di na Judia dum, nāmalite kwa site na Galili rue ebe a.

6 Ma mb͕e Pailat nuru ya, ọ jua ma Nwoke a bu onye Galili.

7 Mb͕e ọ mazuru na O si n’ebe Herod nāchi bia, o we ziga Ya jekuru Herod, onye ya onwe-ya nọ kwa na Jerusalem na mb͕e ahu.

8 Ma mb͕e Herod huru Jisus, Ọ ṅuria ọṅu nke-uku: n’ihi na ọ nāchọ ihu Ya anya n’oge di anya gara aga, n’ihi na ọ nuru ihe bayere Ya; o we nēle anya ihu ihe-iriba-ama di aṅa Ọ gēme.

9 O we jua Ya ajuju n’ọtutu okwu; ma Ya onwe-ya azaghi ya ihe ọ bula.

10 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we guzo, nēbo Ya ebubo si-ike.

11 Herod, ya na ndi-agha-ya, we me Ya ka Ọ buru ihe-efu, o me-kwa-ra Ya ihe-ọchì, we b͕okwasi Ya uwe mara nma nke-uku we zighachi Ya jekuru Pailat.

12 Herod na Pailat we me eyì n’etiti onwe-ha n’ubọchi ahu: n’ihi na n’oge gara aga ha bu ndi-iro.

13 Pailat we kpọkọ ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi na ndi-Ju,

14 si ha, Unu kutaram Nwoke a, dika onye nēduhie ndi-Ju: ma le, mu onwem kpere Ya ikpé n’iru unu, ma ahughim ihe ọ bula n’aru Nwoke a kwesiri ahuhu-nmehie n’ihe nile unu ji bo Ya ebubo:

15 é-è, ọbuná Herod ahugh: n’ihi na o zighachiri Ya nye ayi; le kwa, ọ dighi ihe ọ bula kwesiri ọnwu nke O meworo.

16 Ya mere, m’gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya.

17 Ma ọ di ya nkpà irapuru ha otù onye-nkpọrọ n’ememe.

18 Ma ha nile tiri nkpu n’otù, si, Wepu Nwoke a, ma rapuru ayi Barabas:

19 onye atubàra n’ulo-nkpọrọ n’ihi otù nbili imegide ndi-isi ebiliri nime obodo ahu, ya na ib͕u-madu.

20 Pailat we gwa ha okwu ọzọ, ebe ọ nāchọ irapu Jisus;

21 ma ha tiri nkpu, si, Kpọgide Ya n’obe, kpọgide Ya n’obe.

22 O we si ha nke ub͕ò atọ, É-è, n’ìhi na Onye a mere ihe ọjọ gini? Ahughm ihe kwesiri inwu anwu n’aru Ya: ya mere m’gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya.

23 Ma ha were oké olu rugide, nāriọ ka akpọgide Ya n’obe. Olu-ha we kari ya ike.

24 Pailat we kpebì ka eme ihe ha riọrọ.

25 O we rapuru ha onye ahu atubàrari n’ulo-nkpọrọ n’ihi nbili imegide ndi-isi na ib͕u-madu, onye ha riọrọ n’aka-ya; ma ọ rara Jisus nye ka eme Ya ihe ha chọrọ.

26 Mb͕e ha nēdupu Ya, ha we jide otù onye, bú Saimon, onye Sairini, nke si n’azu obodo ahu bia, ha we bokwasi ya obe-Ya, ka o buru ya so Jisus.

27 Oké ìgwè ndi-Ju nēso kwa Ya, ya na ìgwè ndinyom ndi nēti aka n’obi nākwa-kwa-ra Ya ákwá.

28 Ma Jisus chighariri n’ebe ha nọ, si, Umu-nwanyi Jerusalem, unu akwalaram ákwá, kama nākwaranu onwe-unu na umu-unu.

29 N’ihi na le, ubọchi nābia, mb͕e ha gāsi, Ngọzi nādiri ndinyom àgà, na afọ nke nāmughi nwa, na ara nke nāzùghi nwa.

30 Mb͕e ahu ka ha gāmalite isi ugwu, Dakwasinu ayi; na isi ugwu ntà, Kpuchienu ayi.

31 N’ihi na asi na ha nēme ihe ndia mb͕e osisi di ndu, gini ka agēme mb͕e ọ kpọrọ nku?

32 Ma ndikom abua ọzọ, ndi nālu ọlu ọjọ, ka edukwara, Ya na ha, ka eb͕ue ha.

33 Ma mb͕e ha biara n’ebe anākpọ Okpokoro-isi, n’ebe ahu ka ha kpọgidere Ya na ndi ahu nālu ọlu ọjọ n’obe, otù onye n’aka-nri-Ya na onye ọzọ n’aka-ekpe-Ya.

34 Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n’ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n’etiti onwe-ha ha fere nzà.

35 Ndi-Ju nēguzo kwa, nēkiri. Ndi-isi we me kwa Ya ihe-ọchì, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ya zọputa Onwe-ya, ọ buru na Onye a bu Kraist nke Chineke, Onye Ọ rọputara.

36 Ndi-agha we me kwa Ya ihe-ọchì, nābiakute Ya, nēche kwa n’iru Ya manya-vine b͕ara uka,

37 si, Ọ buru na Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju, zọputa Onwe-gi.

38 Ma ihe-ndekwasi di kwa n’elu isi-Ya, ONYE A BU EZE NDI-JU.

39 Otù nime ndi ahu nālu ọlu ọjọ ndi akwubara nēkwulu kwa Ya, si, Gì onwe-gi abughi Kraist ahu? zọputa Onwe-gi na ayi.

40 Ma ibe-ya zara, we bara ya mba, si, Gì onwe-gi adighi-atu egwu ọbuná Chineke, ebe i nọ n’ọmuma-ikpé ahu?

41 N’ezi-okwu amakwara ayi ikpé ziri ezi; n’ihi na ayi nānata ihe kwesiri ihe ayi mere: ma ọ dighi ihe ọ bula Onye a mehiere.

42 O we si, Jisus, chetam mb͕e ọ bula I gābia n’ala-eze-Gi.

43 Ọ we si ya, N’ezie asim i, Ta ka Mu na gi gānọ na Paradais.

44 Ma ub͕u a ọ di ka oge hour nke-isi, ọchichiri we b͕a n’ala ahu dum rue oge hour nke-iteghete,

45 n’ihi na anyanwu nāb͕a itiri: ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa n’etiti.

46 Mb͕e Jisus tisiri nkpu n’oké olu, Ọ si, Nna, n’aka-Gi ka M’nēnye mọm idebe: mb͕e O kwusiri nka, O we kubìe ume.

47 Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise huru ihe mere, o tobe Chineke, si, N’ezi-okwu Nwoke a bu onye ezi omume.

48 Ìgwè madu nile ndi zukọrọ n’ihe-nkiri a, mb͕e ha kirisiri ihe nile mere, ha we laghachi nēti aka n’obi-ha.

49 Ndi nile ndi mara Ya nke-ọma, na ndinyom ndi soro Ya site na Galili, guzokwara n’ebe di anya, nēle ihe ndia.

50 Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Josef, onye bu onye-nnọkọ-ikpé, ọ bu ezi nwoke buru kwa onye ezi omume,

51 (onye ahu ekweyeghi ìzù-ha na omume-ha), onye sitere n’Arimatia, otù obodo ndi-Ju, onye nēche ala-eze Chineke:

52 onye ahu jekuru Pailat, riọ aru Jisus.

53 O we budata ya, ke ya n’ezi ákwà ọcha, we tọb͕ọ Ya n’ílì nke egwuwara ya-ri na nkume, nke akātọb͕ọghi onye ọ bula nime ya.

54 Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe, ubọchi-izu-ike nēru kwa nso.

55 Ndinyom, ndi si na Galili soro Ya bia, we so n’azu, le ílì ahu, na otú atọb͕ọrọ aru-Ya.

56 Ha we laghachi, dozie uda utọ di ichi iche na manu-otite.

N’ubọchi-izu-ike ha we nọdu nwayọ dika ihe enyere n’iwu si kwu.

Categories
LUK

LUK 24

1 Ma n’ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, n’oké isi-ututu, ha biaruru ílì ahu, nēbute uda utọ di iche iche nke ha doziri.

2 Ha we hu nkume ahu na akpọrepuwo ya n’ílì.

3 Ha we ba nime, ma ha ahughi aru nke Onye-nwe-ayi Jisus.

4 O we rue, mb͕e ha nọ n’obi abua n’ihi nka, le, ndikom abua guzoro ha nso n’uwe nēb͕u àmùmà:

5 ma mb͕e ha nātu egwu, nērube kwa iru-ha n’ala, ha si ha, Gini mere unu nāchọ Onye di ndu n’etiti ndi nwuru anwu?

6 Ọ nọghi n’ebe a, kama emere ka O si n’ọnwu bilie: chetanu otú Ọ gwara unu okwu mb͕e Ọ nọ kwa na Galili,

7 si, na aghaghi irara Nwa nke madu nye n’aka ndikom nēmehie emehie, na aghaghi kwa ikpọgide Ya n’obe, na Ọ ghaghi kwa isi n’ọnwu bilie n’ubọchi nke-atọ.

8 Ha we cheta okwu-Ya,

9 we si n’ílì ahu laghachi, kọrọ ndi-ozi iri na otù, na ndi nile fọduru, ihe ndia nile.

10 Ma ha bu Meri Magdalini, na Joana, na Meri nne Jemes: ndinyom fọduru ndi soro ha we gwa ndi-ozi-Ya ihe ndia.

11 Okwu ndia we di ka okwu efu n’anya-ha; ha ekweghi kwa ha.

12 Ma Pita biliri, b͕a ọsọ jerue ílì; o we ruru ala, nyo nime ya, we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ nání ha; o we la n’ulo-ya, ihe nke meworo nēju kwa ya anya.

13 Ma le, ubọchi ahu ndikom abua nime ha nāga otù obodo ntà, aha-ya bu Emeus, nke di ọgu mail atọ site na Jerusalem.

14 Ndi ahu nākparita kwa n’etiti onwe-ha uka bayere ihe ndia nile mereri.

15 O we rue, mb͕e ha nākparita uka nājurita kwa onwe-ha ajuju, Jisus onwe-ya we biarue nso, so kwa ha ga.

16 Ma eb͕ochiri ha anya ka ha ghara ima Ya.

17 O we si ha, Gini bu okwu ndia unu nāgwarita onwe-unu, ka unu nāga ije? Ha we guzo nāb͕aru iru.

18 Otù onye nime ha, aha-ya bu Kleopas, we za, si Ya, Ọ̀ bu nání Gi onwe-gi nọ dika ọbìa na Jerusalem nāmaghi ihe mere nime ya n’ubọchi ndia?

19 Ọ si ha, Ihe gini? Ha si Ya, Ihe bayere Jisus Onye Nazaret, Onye bu onye-amuma di ike n’ọlu na okwu n’iru Chineke na ndi-Ju nile:

20 ya na otú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi-ayi rara Ya nye ka ama Ya ikpé ọnwu, we kpọgide Ya n’obe.

21 Ma ayi onwe-ayi lere anya na Ya onwe-ya bu onye gaje ib͕aputa Israel. E, tukwasi kwa ihe ndia nile, ta bu ubọchi nke-atọ site na mb͕e ihe ndia mere.

22 Ma ndinyom ufọdu n’etiti ayi mekwara ka ibobo nwua ayi n’aru, n’ihi na ha jere ílì-Ya n’isi-ututu;

23 mb͕e ha nāhughi aru-Ya, ha we bia, si, na ha hukwarari ọhù, bú ndi-mọ-ozi, ndi siri na Ọ di ndu.

24 Ufọdu n’etiti ndi soro ayi we je ílì ahu, hu kwa ya ọbuná otú ndinyom ahu kwuru: ma Ya onwe-ya ka ha nāhughi.

25 Ya onwe-ya we si ha, Unu ndi nēnweghi uche, ndi di kwa urè n’obi ikwere n’ihe nile ndi-amuma kwuru!

26 Ọ̀ bughi na Kraist aghaghi ihu ahuhu ndia, na ibà n’ebube-Ya?

27 O we malite isi n’akwukwọ Moses, si kwa n’akwukwọ ndi-amuma nile, me ka ha mata isi okwu bayere Onwe-ya n’ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ.

28 Ha we biarue obodo ntà ahu nso, ebe ha nāga: ma Ya onwe-ya mere dika Ọ nāga n’iru.

29 Ha we rugide Ya, si, Nọyere ayi: n’ihi na o rubewo anyasi, ubọchi agamiwo kwa ub͕u a. O we ba n’ulo inọyere ha.

30 O we rue, mb͕e Ya na ha nọdusiri na nri, na O were ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, we nēnye ha.

31 Ewe saghe anya-ha, ha we mara Ya; Ya onwe-ya we funari n’anya-ha.

32 Ha we sirita onwe-ha, Òbi-ayi ekpoghi ọku nime ayi, mb͕e Ọ nāgwa ayi okwu n’uzọ, mb͕e Ọ nēmeghere ayi ihe edeworo n’akwukwọ nsọ?

33 Ha we bilie n’oge hour ahu, laghachi na Jerusalem, we hu ndi-ozi iri na otù ahu, na ndi ha na ha nọ, ka ha zukọrọ,

34 nāsi, N’ezi-okwu Onye-nwe-ayi esiwo n’ọnwu bilie, were kwa Onwe-ya gosi Saimon.

35 Ha onwe-ha we kọ ihe mere n’uzọ, na otú ha mara Ya n’inyawa ob͕e achicha ahu.

36 Ma mb͕e ha nēkwu ihe ndia, Ya onwe-ya guzoro n’etiti ha, si ha, Udo diri uno.

37 Ma ha turu ujọ, tu kwa egwu, ha we chè na ha huru mọ.

38 O we si ha, Gini mere obi nālọ unu miri? n’ìhi gini ka iru-uka nēbili kwa n’obi-unu?

39 Lenu akam na ukwum, na ọ bu Mu onwem: datunum aka, le-kwa-nu; n’ihi na mọ enweghi anu-aru na ọkpukpu, otú unu huru na Mu onwem nwere.

40 Mb͕e O kwusiri nka, O we gosi ha aka-Ya na ukwu-Ya.

41 Ma mb͕e ha nọ nēkweghi ekwe n’ihi ọṅù, mb͕e ọ nēju kwa ha anya, Ọ si ha, Ùnu nwere ihe-oriri ọ bula n’ebe a?

42 Ha we nye Ya òkè nime azù aruru aru.

43 O we nara ya, rie n’iru ha.

44 O we si ha, Ndia bu okwum nke M’gwara unu, mb͕e Mu na unu nọ-kwa-ra, na ihe nile aghaghi imezu, bú nke edeworo n’akwukwọ iwu Moses, na ndi-amuma, na abù ọma bayerem.

45 Mb͕e ahu ka O meghere uche-ha, ka ha we ghọta ihe edeworo n’akwukwọ nsọ;

46 O we si ha, Otú a ka edeworo ya n’akwukwọ nsọ, na Kraist ahu gāhu ahuhu, si kwa na ndi nwuru anwu bilie n’ubọchi nke-atọ;

47 na agēkwusa kwa nchèghari na nb͕aghara nmehie n’aha-Ya gwa mba nile, nāmalite site na Jerusalem.

48 Unu onwe-unu bu ndi-àmà nke ihe ndia.

49 Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwà nke Nnam n’isi-unu: ma nọdunu n’obodo a, rue mb͕e agēwere ike nke si n’elu yikwasi unu.

50 O we dupu ha rue n’uzọ Betani: O we chilie aka-Ya elu, gọzie ha.

51 O we rue, mb͕e Ọ nāgọzi ha, na Ọ kewapuru n’ebe ha nọ, ewe welie Ya la n’elu-igwe.

52 Ndi ahu we kpọ isi ala nye Ya, we ji oké ọṅù laghachi na Jerusalem:

53 ha we nānọ n’ulo uku Chineke mb͕e nile, nāgọzi Chineke.