Categories
LUK

LUK 11

1 O rue, mb͕e Ọ nēkpe ekpere n’otù ebe, mb͕e O kpebìri, na otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Onye-nwe-ayi, zí ayi ikpe ekpere, dika Jọn zikwara ndi nēso uzọ-ya.

2 O we si ha, Mb͕e ọ bula unu nēkpe ekpere, sinu, Nna, Ka edo aha-Gi nsọ. Ka ala-eze-Gi bia.

3 Nēnye ayi nri kwa-ubọchi nke gēzuru ayi n’ubọchi ta.

4 B͕aghara kwa ayi nmehie nile ayi; n’ihi na ayi onwe-ayi nāb͕aghara kwa onye ọ bula nke ji ayi ugwọ. Ewebà-kwa-la ayi nime ọnwunwa.

5 O we si ha, Ònye nime unu gēnwe eyì, gējeku kwa ya n’etiti abali, si ya, Eyìm, binyem ob͕e achicha atọ;

6 n’ihi na otù eyìm esiwo n’ije biakutem, ma enweghm ihe ọ bula m’gēdebe n’iru ya;

7 ma onye ahu gēsi nime ulo za, si, Esob͕ulam: emechiwo uzọ ub͕u a, mu na umu-ntakirim nēdina kwa n’ihe-ndina-ayi; apughm ibili inye gi?

8 Asim unu, Ọ buru kwa na ọ gaghi-ebili inye ya n’ihi na ọ bu eyì-ya, ma n’ihi aririọ-ya nēnweghi ihere ọ gēbili nye ya ka ihe di ya nkpà ra.

9 Mu onwem si kwa unu, Riọnu, agēnye kwa unu, chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu.

10 N’ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere.

11 Ma ònye n’etiti unu, bú nna, ka nwa-ya gāriọ ob͕e achicha, ọ nye ya nkume? ma-ọbu azù, ọ nye ya agwọ n’ọnọdu azù?

12 Ma-ọbu asi na ọ gāriọ àkwá ọkuku, ọ̀ gēnye ya akpi?

13 Ya mere, ọ buru na unu onwe-unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu nke elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari Mọ Nsọ nke-uku nye ndi nāriọ Ya?

14 Ọ nāchupu kwa mọ ọjọ nke dara ob͕i. O we rue, mb͕e mọ ọjọ ahu putasiri, na onye-ob͕i ahu kwuru okwu; O we ju ìgwè madu nile anya.

15 Ma ufọdu nime ha siri, N’ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.

16 Ndi ọzọ nāchọ ihe-iriba-ama n’aka-Ya site n’elu-igwe, n’ihi na ha nānwa Ya.

17 Ma ebe Ya onwe-ya matara èchìchè-uche nile ha, Ọ si ha, Ala-eze ọ̀ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n’efu; ulo nke kewakwara megide ulo nāda.

18 Ma ọ buru kwa na Setan kewara megide onwe-ya, àla-eze-ya gēsi aṅa guzo? n’ihi na unu nāsi na anamachupu ndi-mọ ọjọ n’ike Beelzebul.

19 Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n’ike Beelzebul, n’ike onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n’ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.

20 Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n’ike nkpisi-aka Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru.

21 Mb͕e ọ bula onye di ike nke kezuru ihe-agha-ya nēche obí nke aka ya, ihe o nwere adi n’udo:

22 ma mb͕e ọ bula onye ka ya ike gābia imegide ya, meri kwa ya, ọ nara ya ihe-agha-ya dum nke ọ tukwasiriri obi-ya, keri kwa ihe ọ nara ya.

23 Onye nādighi n’akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.

24 Mb͕e ọ bula mọ nādighi ọcha siri n’aru madu pua, ọ nāgabiga n’ebe miri nādighi nāchọ izu-ike: ma ebe ọ dighi-achọta ya, ọ si, M’gālaghachi n’ulom ebe m’siri puta.

25 Mb͕e ọ biara, o we hu ya ka azachasiri ya dozisia ya.

26 Mb͕e ahu ọ ga, chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ tiyere onwe-ya; ha we ba biri n’ebe ahu: ọnọdu ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu.

27 O we rue, mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, na otù nwanyi si n’etiti ìgwè madu ahu weli olu-ya, si Ya, Ngọzi nādiri afọ nke buru Gi, na ara nke I miri.

28 Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya.

29 Ma mb͕e ìgwè madu nēzukọ n’ebe Ọ nọ, Ọ malitere isi, Ọb͕ọ a bu ajọ ọb͕ọ: ọ nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona.

30 N’ihi na dika Jona ghọrọ ndi Nineve ihe-iriba-ama, otú a ka Nwa nke madu gādi-kwa-ra ọb͕ọ a.

31 Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ndikom nke ọb͕ọ a bilie n’ikpé ahu, ọ gāma kwa ha ikpé: n’ihi na o siri n’ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomom; ma le, Onye ka Solomom nọ n’ebe a.

32 Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n’ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n’ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n’ebe a.

33 Ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nādọba ya n’ebe di nzuzo, ma-ọbu n’okpuru mb͕é, kama n’elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nābà nime ulo we hu ìhè-ya.

34 Oriọna nke aru-gi bu anya-gi: mb͕e ọ bula anya-gi nēle otù ebe, aru-gi dum juputa-kwa-ra n’ìhè; ma mb͕e ọ bula ọ jọrọ njọ, aru-gi juputa-kwa-ra n’ọchichiri.

35 Ya mere, le anya ma ihè di nime gi abughi ọchichiri.

36 Ya mere, ọ buru na aru-gi dum ejuputa n’ìhè, ghara inwe akuku ọ bula b͕ara ọchichiri, aru ahu dum gējuputa n’ìhè, dika mb͕e oriọna, site n’ìhè-ya nēnwu, nēnye gi ìhè.

37 Ma mb͕e Ọ nēkwu okwu, onye-Farisi kpọrọ Ya ka O so ya rie nri-ututu: O we ba, nọdu na nri.

38 Ma mb͕e onye-Farisi ahu huru ihe Ọ nēme, o ju ya anya na O bughi uzọ kwo aka-Ya mb͕e Ọ gaje iri nri-ututu.

39 Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ub͕u a ka unu onwe-unu, bú ndi-Farisi, nēme ka azú iko na afere di ọcha; ma ime-unu juputara n’ipunara-madu-ihe na ajọ ihe.

40 Unu ndi nēnweghi uche, Onye ahu Nke mere azú iko, ọ̀ bughi Ya me-kwa-ra ime-ya?

41 Otú ọ di, werenu ihe di nime lua ọlu ebere; ihe nile di kwa ọcha n’ebe unu nọ.

42 Ma ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n’ihi na unu nēnye otù uzọ n’uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsi ísì utọ na rue na nkpa-akwukwọ nile, ma unu nagabiga ikpé na ihu-n’anya Chineke: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.

43 Ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n’ihi na unu nāhu isi oche nile n’ulo-nzukọ nile, na ekele n’ọma-ahia nile, n’anya.

44 Ahuhu gādiri unu; n’ihi na unu di ka ílì nke nāputaghi ìhè, nke madu ndi nējeghari n’elu ha nāmataghi ya.

45 Ma otù onye nime ndi-iwu zara, si Ya, Onye-ozizí, n’ikwu okwu a I nēme kwa ayi ihe-ihere.

46 O we si, Ahuhu gādi-kwa-ra unu ndi-iwu; n’ihi na unu nēbo madu ibu di ike obubu, ma unu onwe-unu ejighi otù nime nkpisi-aka-unu kpatu ibu ahu.

47 Ahuhu gādiri unu; n’ihi na unu nēwu ebe anēlì ndi-amuma, ma nna-unu-hà b͕uru ha.

48 Ya mere unu bu ndi-àmà, ọlu nna-unu-hà di kwa unu ezi nma: n’ihi na ha onwe-ha b͕uru ha, ma unu onwe-unu nēwu ebe anēlì ha.

49 N’ihi nka amam-ihe Chineke kwu-kwa-ra, si, M’gēzigara ha ndi-amuma na ndi-ozi; ufọdu nime ha ka ha gēb͕u kwa sob͕u kwa;

50 ka ewe chọputa ọbara ndi-amuma nile, nke awusiworo site na ntọ-ala uwa, n’aka ọb͕ọ a;

51 site n’ọbara Ebel rue ọbara Zakaraia, onye lara n’iyì n’ab͕ata ebe-ichu-àjà na ulo nsọ unu: e, asim unu, agāchọputa ya n’aka ọb͕ọ a.

52 Ahuhu gādiri unu ndi-iwu; n’ihi na unu wepuru nkpisi-ugodi nke ọmuma-ihe: unu onwe-unu abataghi, unu b͕ochi-kwa-ra ndi nābata.

53 Mb͕e O siri n’ebe ahu puta, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite inọgide Ya si-ike, na ikpasu Ya ikwu okwu bayere ọtutu ihe;

54 nēche Yá anwu, inwude ihe nke gēsi n’ọnu-Ya puta.

Categories
LUK

LUK 12

1 N’oge ahu, mb͕e oké ọtutu ìgwè madu anādighi-aguta aguta zukọrọ, nke mere ka ha nāzọkwasi ibe-ha ukwu, O buru uzọ malite isi ndi nēso uzọ-Ya, Nēzenu ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, nke bu iru-abua.

2 Ma ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe: ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama.

3 Ya mere ihe ọ bula unu kwuru n’ọchichiri, agānu ya n’ìhè; ihe unu kwu kwa-ra na nti n’ime-ulo ntà, agēkwusa ya n’elu ulo.

4 Ma asim unu ndi-eyim, Unu atula egwu ndi nēb͕u aru, ma emesia ha enweghi ihe ọzọ kari nke ahu ha gēme.

5 Ma M’gēgosi unu Onye unu gātu egwu: tuanu egwu Onye ahu, Nke nwere ike itubà n’ọku ala-mọ mb͕e O b͕usiri; e, asim unu, Tuanu egwu Onye ahu.

6 Àdighi-ere egwele ise na penny abua? ma adighi-echezọ otù nime ha n’iru Chineke.

7 Ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo. Unu atula egwu: ọnu-ahia-unu kariri nke ọtutu egwele.

8 Ma asim unu, Onye ọ bula nke gēkwuputam n’iru madu, ya ka Nwa nke madu gēkwuputa kwa n’iru ndi-mọ-ozi nke Chineke:

9 ma onye gāgọnarim n’iru madu, agāgọnari ya n’iru ndi-mọ-ozi nke Chineke.

10 Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya: ma agaghi-ab͕aghara onye gēkwulu Mọ Nsọ.

11 Ma mb͕e ọ bula ha kpọrọ unu bia n’iru ulo-nzukọ, na ndi-isi, na ndi nāchi isi, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gāgọpu onwe-unu ma-ọbu ihe unu gēji gọpu onwe-unu, ma-ọbu ihe unu gēkwu:

12 n’ihi na Mọ Nsọ gēzí unu n’oge hour ahu ihe unu nāghaghi ikwu.

13 Ma otù onye sitere n’igwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, gwa nwa-nnem nwoke ka o kère ihe-nketa-ayi nyem.

14 Ma Ọ siri Ya, Nwoke, ònye merem ka M’buru onye-ikpé ma-ọbu onye-òkìkè n’ebe unu nọ?

15 O we si ha, Lezienu anya, debe-kwa-nu onwe-unu ka unu ghara inwe anya-uku ọ bula: n’ihi na ọ bughi n’ihe ọ nwebigara ókè ka ndu madu di, o sighi n’ihe o nwere puta.

16 O we turu ha ilu, si, Ala otù ọgaranya miri nkpuru ri nne:

17 o we tugharia n’obi-ya, si, Gini ka m’gēme, n’ihi na enweghm ebe ikpokọta nkpurum?

18 O we si, Nka ka m’gēme: m’gēweda ọbam, wu kwa nke ka uku; n’ebe ahu ka m’gēkpokọta ọkam nile na ezi ihem nile.

19 M’gāsi kwa nkpuru-obim, Nkpuru-obi, i nwere ọtutu ezi ihe edebere nye gi rue ọtutu arọ; nēzu ike, nēri ihe, nāṅu ihe-ọṅuṅu, ka obi nātọ gi utọ.

20 Ma Chineke siri ya, Onye nēnweghi uche, n’abali a ka anāchọ mkpure-obi-gi n’aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha?

21 Otú a ka ọ di, bú onye nākpadoro onwe-ya àkù, ma ọ bughi ọgaranya n’ebe Chineke nọ.

22 Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, N’ihi nka ka M’ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi.

23 N’ihi na ndu kariri ihe eji azù ya, aru kari-kwa-ra uwe-oyiyi-ya.

24 Tugharinu uche n’ugolo-ọma, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewe kwa ihe ubi; nke nēnweghi ime-ulo ntà ma-ọbu ọba; ma Chineke nāzù ha: ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari anu-ufe nke-uku?

25 Ma ònye n’etiti unu puru itukwasi otù cubit n’ogologo-ya site n’icheb͕u onwe-ya?

26 Ya mere ọ buru na unu apughi ime ọbuná nke dikarisiri ntà, gini mere unu nēcheb͕u onwe-unu n’ihe fọduru?

27 Tugharinu uche n’ahihia nke ọhia, otú ha nētó etó: ha adọb͕ughi onwe-ha n’ọlu, ha atughi kwa ogho; ma asim unu, Ọbuná Solomom n’ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia.

28 Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia di n’ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n’ite ọku; Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà?

29 Unu onwe-unu achọ-kwa-la ihe unu gēri, na ihe unu gāṅu, unu enwe-kwa-la obi abua.

30 N’ihi na ihe ndia nile ka mba nile nke uwa nāchọ: ma Nna-unu nāmata na ihe ndia di unu nkpà.

31 Otú ọ di, chọnu ala-eze-Ya, agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia.

32 Atula egwu, ìgwè aturu ntà; n’ihi na ọ di Nna-unu ezi nma inye unu ala-eze-Ya.

33 Renu ihe unu nwere, were ha lua ọlu ebere; merenu onwe-unu àkpà-ego nke nādighi-aka nká, àkù nādighi-agwu agwu n’elu-igwe, ebe onye-ori nādighi-abia nso, ebe nla nādighi-emebi kwa ihe.

34 N’ihi na ebe àkù-unu di, n’ebe ahu ka obi-unu gādi kwa.

35 Ka eke unu ihe-ọkiké n’úkwù, ka oriọna-unu nēnwu kwa;

36 unu onwe-unu, yikwara ndi nēche onye-nwe-ha, mb͕e ọ gēsi n’oriri ọlulu-nwunye laghachi; ka, mb͕e ọ gābia ku aka n’ọnu-uzọ, ka ha we meghere ya ngwa ngwa.

37 Ngọzi nādiri ndi-orù ahu, ndi, mb͕e onye-nwe-ha gābia, ọ gāhu ka ha nēche nche: n’ezie asim unu, na ọ gēke onwe-ya ihe-ọkiké n’úkwù, me ka ha nọdu na nri, ọ gābia kwa jere ha ozi.

38 Ọ buru kwa na ọ gābia na nche nke-abua, ọ buru kwa na nke-atọ, hu kwa ha otú a, ngọzi nādiri ndi-orù ahu.

39 Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge hour onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-arapu kwa ulo-ya ka egwupú ya.

40 Unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.

41 Pita we si, Onye-nwe-ayi, Ọ̀ bu ayi ka I nāturu ilu a, ma-ọbu madu nile kwa?

42 Onye-nwe-ayi we si, Ònye kwa bu onye ahu nāchi èzí-na-ulo, onye kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya gēme onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha òkè nri ha n’oge-ya?

43 Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a.

44 N’ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere.

45 Ma ọ buru na orù ahu gāsi n’obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya ibia; ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndikom na ndinyom nēje ozi aka, na iri ihe-oriri na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅubiga manya ókè;

46 onye-nwe orù ahu gābia n’ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n’oge hour ọ nāmaghi, ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, ke òkè nye ya n’etiti ndi nēkwesighi ka atukwasi ha obi.

47 Ọzọ, orù ahu, nke mara ihe onye-nwe-ya chọrọ, ma o dozighi, o meghi kwa dika ọ chọrọ, agāpia ya ọtutu utari;

48 ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n’aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n’aka idebe, n’aka-ya ka ha gāju ihe nke ka.

49 Abiaram itusa ọku n’elu uwa; ma gini ka M’nāchọ, ọ buru na afunwuwo ya-ri ub͕u a?

50 Ma enwerem baptism agēji mem baptism; ọ nēb͕ukwam nb͕u n’obi nke-uku rue mb͕e agēmezu ya.

51 Ùnu nēchè na abiaram inye udo n’uwa? asim unu, É-è; kama nkewa:

52 n’ihi na site n’ub͕u a madu ise ndi kewaworo ekewa gādi n’otù ulo, madu atọ megide madu abua, madu abua megide kwa madu atọ.

53 Agēkewa ha, nna megide nwa-ya nwoke, nwa-nwoke megide kwa nna-ya; nne megide nwa-ya nwanyi, nwa-nwanyi megide kwa nne-ya; nne di megide nwunye nwa-ya, nwunye nwa megide kwa nne di-ya.

54 O we si kwa ìgwè madu nile, Mb͕e ọ bula unu huru igwe-oji ka o si n’Ọdida-anyanwu nārigo, ngwa ngwa unu nāsi, Nshansha-miri nābia; o were mee otua.

55 Mb͕e ọ bula unu hukwara ifufe Ndida ka ọ nēfe, unu nāsi, Ifufe di ọku gādi; o we me.

56 Ndi-iru-abua, unu matara itule iru ala na elu-igwe; ma òle ka o si di na unu amataghi itule oge a?

57 Ma gini mere unu adighi-ekpe n’onwe-unu ihe ziri ezi?

58 N’ihi na mb͕e gi na onye nēkuru gi ga ikpé nāga n’iru onye-isi, mesie ike ipu n’aka-ya n’uzo; ka ọ ghara idọkpuru gi nye onye-ikpé ma eleghi anya, onye-ikpé gārara kwa gi nye n’aka onye nēnye ndi-nmehie ahuhu, onye ahu nēnye ndi nmehie ahuhu gātubà kwa gi n’ulo-nkpọrọ

59 Asim i, I gaghi-aputa n’ebe ahu ma-ọli, rue mb͕e i gākwughachi ọbuná ego ntà ikpe-azu.

Categories
LUK

LUK 13

1 Ma ufọdu nọ n’ebe ahu n’oge ahu ndi kọrọ Ya akukọ bayere ndi Galili ahu, ndi Pailat were ọbara-ha gwakọta n’àjà-ha.

2 O we za, si ha, Ùnu nēchè na ndi Galili ndia bu ndi-nmehie kari ndi Galili nile, n’ihi na ha ahuwo ahuhu ndia?

3 Asim unu, É-è: kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n’iyì otú ahu.

4 Ma-ọbu madu iri na asatọ ahu, ndi ulo-elu di na Sailoam dakwasiri ha, we b͕ue ha, ùnu nēchè na ndi ahu bu ndi ji ugwọ kari madu nile ndi bi na Jerusalem?

5 Asim unu, É-è; kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n’iyì otú a.

6 O we tua ilu a; Otù onye nwere osisi fig akuru n’ubi-vine-ya; o we bia nāchọ nkpuru n’elu ya, ma ọ hughi.

7 O we si onye-ọlu-vine-ya, Le, site n’arọ atọ rue ub͕u a ka m’nābia nāchọ nkpuru n’osisi fig a, ma ahughm: b͕utue ya; gini mere ọ nēme kwa ka ala la n’iyì?

8 O we za, si ya, Onye-nwe-ayi, rapu kwa ya arọ a, rue mb͕e m’gēgwu ala-ya buruburu, wusa kwa ya ǹsí-anu:

9 ọ buru kwa na ọ mia nkpuru site n’ub͕u a, ọ di nma; ma ọ buru na ọ mighi, i gēb͕utu ya.

10 O we nēzí ihe n’otù nime ulo-nzukọ-ha n’ubọchi-izu-ike.

11 Ma le, otù nwanyi nke nwere mọ nke nēme ka aru-ya ghara idi ike arọ iri na asatọ; o rudakwara ala, ọ pughi kwa iweli onwe-ya elu ma-ọli.

12 Ma mb͕e Jisus huru nwanyi ahu, Ọ kpọ ya, si ya, Nwanyi, emewo gi ka i pua na nriaria-gi.

13 O we tukwasi nwanyi ahu aka-Ya abua: ngwa ngwa ewe me ka o guzozie ọtọ, o we nye Chineke otuto.

14 Ma onye-isi ulo-nzukọ ahu, ebe iwe were ya nke-uku n’ihi na Jisus mere ka aru madu di ike n’ubọchi-izu-ike, ọ zara, si ìgwè madu ahu, Ubọchi isi di nke madu aghaghi ilu ọlu nime ha: ya mere, bianu nime ha ka eme ka aru-unu di ike, unu abiakwala n’ubọchi-izu-ike.

15 Ma Onye-nwe-ayi zara ya, si, Ndi-iru-abua; onye ọ bula nime unu, ọ̀ dighi-atọpu ehi-ya ma-ọbu inyinya-ibu-ya n’ulo anu-ulo n’ubọchi-izu-ike, duru ya ga ime ka ọ ṅua miri?

16 Ma nwanyi a, ebe ọ bu nwa Abraham, onye Setan kere ab͕u, le, arọ iri na asatọ, ò kwesighi ka atọpu ya n’ab͕ú a n’ubọchi-izu-ike?

17 Mb͕e Ọ nēkwu ihe ndia, ewe me ka ihere me ndi nile nēmegide Ya: ìgwè madu ahu nile nāṅuri kwa ọṅu n’ihi ihe-ebube nile Ọ nēme.

18 Ya mere O kwuru, si, Gini ka ala-eze Chineke yiri? gini ka M’gēji kwa tunyere ya?

19 O yiri nkpuru mustard, nke madu were, tubà n’ubi nke aka ya ab͕ara ogige; o we ba uba, ghọ osisi; anu-ufe nke elu-igwe we nọ n’alaka-ya.

20 Ọzọ kwa Ọ siri, Gini ka M’gēji tuyere ala-eze Chineke?

21 O yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri.

22 O we nāga n’obodo na obodo ntà di iche iche, nēzí ihe, nāga kwa ije-Ya iru Jerusalem.

23 Otù onye we si Ya, Onye-nwe-ayi, Ǹdi anāzọputa di madu ole-na-ole? O we si ha,

24 Jisienu ike isi n’ọnu-uzọ di warara ba: n’ihi na ọtutu madu, ka M’si unu, gāchọ ibà nime ya, ma ha agaghi-enwe ike.

25 Mb͕e Nna-nwe-ulo gēbiliwori, mechi kwa uzọ-Ya, unu we malite iguzo n’èzí, na iku aka n’ọnu-uzọ ahu, si Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ; ma Ọ gāza, si unu, Amataghim unu, ebe unu si bia;

26 mb͕e ahu ka unu gāmalite isi, Ayi riri ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n’iru Gi, I zíkwara ihe n’amá-ayi;

27 ma Ọ gāsi, Asim unu, amataghm ebe unu si bia; puanu n’irum, ndi nile nālu ọlu ajọ omume.

28 N’ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita ikekere-ezé ahu gādi, mb͕e unu gāhu Abraham, na Aisak, na Jekob, na ndi-amuma nile, n’ala-eze Chineke, ma unu onwe-unu aburu ndi achupuru n’èzí.

29 Ha gēsi kwa n’Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu, si kwa n’Ugwu na Ndida, bia, nọdu kwa n’ala-eze Chineke.

30 Ma le, ndi-ikpe-azu di ndi gēbu uzọ, ndi bu uzọ di kwa ndi gābu ndi-ikpe-azu.

31 N’oge hour ahu ndi-Farisi ufọdu biakutere Ya, si Ya, Pua, si n’ebe a la: n’ihi na Herod nāchọ ib͕u Gi.

32 O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n’ubọchi nke-atọ emekwam ka M’zu okè.

33 Otú ọ di, aghaghi m iga ta na echi na ubọchi so ya: n’ihi na apughi ikwe ka onye-amuma la n’iyì n’ebe nābughi Jerusalem.

34 Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M’chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nnekwu-ọkuku nāchikọ umu nke aka ya n’okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!

35 Le, anārapuru unu ulo-unu: ma asim unu, Unu agaghi-ahum ma-ọli, rue mb͕e unu gāsi, Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n’aha Onye-nwe-ayi.

Categories
LUK

LUK 14

1 O rue, mb͕e Ọ batara n’ulo otù onye nime ndi-isi nke ndi-Farisi iri nri n’ubọchi-izu-ike, na ndi ahu nēche Ya nche.

2 Ma le, otù nwoke nọ n’iru Ya nke nwere ọria aru-miri.

3 Jisus we za, gwa ndi-iwu na ndi-Farisi okwu, si, Ò ziri ezi n’iwu ime ka aru madu di ike n’ubọchi-izu-ike, ma-ọbu na o zighi ezi?

4 Ma ha kpuchiri ọnu. O we jide ya aka, me ka aru di ya ike, we rapu ya ka ọ la.

5 O we si ha, Ọ̀ bu nwa-nwoke ma-ọbu ehi nke onye n’etiti unu gādabà n’olùlù-miri, ma onye ahu agaghi-adọkpulite ya elu ngwa ngwa n’ubọchi-izu-ike?

6 Ma ha enweghi ike iza okwu ndia ọzọ.

7 O we turu ndi akpọrọ ilu, mb͕e Ọ ribara ama otú ha nārọrọ isi ọnọdu; nāsi ha,

8 Mb͕e ọ bula madu gākpọ gi n’oriri ọlulu-nwunye, anọdula n’isi ọnọdu; ma eleghi anya ọ kpọwori otù onye ka gi na nsọpuru,

9 onye kpọrọ gi na ya we bia si gi, Nye nwoke a ọnọdu; mb͕e ahu i gāmalite iji ihere were ọnọdu ikpe-azu.

10 Ma mb͕e ọ bula agākpọ gi, ga nọdu n’ọnọdu ikpe-azu; ka, mb͕e onye kpọworo gi gābia, ka o we si gi, Eyìm, rigo n’ọnọdu ka elu: mb͕e ahu i gēnwe otuto n’iru ndi nile gi na ha nānọdu na nri.

11 N’ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.

12 O we si kwa onye kpọrọ Ya-ri, Mb͕e ọ bula i siri nri-ututu ma-ọbu nri-anyasi, akpọla ndi-eyì-gi, ma-ọbu umu-nne-gi, ma-ọbu ndi-ikwu-gi, ma-ọbu ndi-ab͕ata-obi-gi, bú ndi ọgaranya; ka ha onwe-ha we ghara ikpọghachi kwa gi ma eleghi anya, ewe nyeghachi gi ihe.

13 Kama mb͕e ọ bula i siri nri uku, kpọ ndi-ob͕eye, ndi-ọlusi, ndi-ngwurọ, ndi-ìsì:

14 onye-ngọzi ka i gābu; n’ihi na ha enweghi ihe inyeghachi gi: n’ihi na agēnyeghachi gi na nbilite-n’ọnwu nke ndi ezi omume.

15 Ma mb͕e otù onye nime ndi soro Ya nọdu na nri nuru ihe ndia, ọ si Ya, Ngọzi nādiri onye gēri nri n’ala-eze Chineke.

16 Ma Ọ siri ya, Otù nwoke siri nri-anyasi uku; we kpọ ọtutu madu:

17 o we zipu orù-ya n’oge hour nke nri-anyasi ahu isi ndi akpọwori, Bianu; n’ihi na edoziwo ihe nile ab͕u a.

18 Ma ha nile were otù olu malite iriọ ka arapu ha. Onye mbu siri ya, Azutaram ubi, ọ dikwam nkpà ipu gāle ya: ariọm gi guam n’onye riọrọ ka arapu ya.

19 Onye ọzọ si-kwa-ra, Azutaram ehi ọlu iri ejikọrọ abua abua, anamaga kwa inwa ha: ariọm gi guam n’onye riorọ ka arapu ya.

20 Onye ọzọ sikwara, Alurum nwunye, n’ihi nka apughi m ibia.

21 Orù ahu we bia, kọrọ onye-nwe-ya ihe ndia. Mb͕e ahu nna-nwe-ulo ahu, ebe iwe were ya, ọ si orù-ya, Pua ọsọsọ ga n’amá nile na uzọ ntà nile nke obodo, kpọbata n’ebe a ndi-ob͕eye na ndi-ọlusi na ndi-ìsì na ndi-ngwurọ.

22 Orù ahu we si, Onye-nwe-ayi, emewo ihe i nyere n’iwu, ọnọdu fọdu-kwa-ra.

23 Onye-nwe-ulo ahu we si orù-ya Pua ga n’uzọ nile na ogige nile, rugide kwa madu ka ha bata, ka ulom we juputa.

24 N’ihi na asim unu, na ọ dighi otù onye nime ndikom ahu ndi akpọworo gēdetu nri-anyasim ire.

25 Ma oké ìgwè madu nēso ya je: O we chigharia, si ha,

26 Ọ buru na onye ọ bula abiakutem, ma ọ kpọghi nna nke ya asì, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na umu nke ya, na umu-nne-ndikom nke ya, na umu-nne-ndinyom nke ya, e, ndu nke aka ya kwa, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.

27 Onye ọ bula nke nēbughi obe nke aka ya, sokwam n’azu, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.

28 N’ihi na ònye nime unu, nke nāchọ íwu ulo-elu, nēbughi uzọ nọdu ala gu ego ọ gēwe, ma o nwere ego ọ gēji lusia ya?

29 Ka ndi nile ndi nāhu ya we ghara imalite ime ya ihe-ọchì ma eleghi anya, mb͕e ọ tọsiri ntọ-ala-ya, ma o nweghi ike iwuzu ya,

30 si, Nwoke a malitere iwu ulo, ma o nweghi ike iwusi ya.

31 Ma-ọbu òle eze, mb͕e ọ nāga ibu agha megide eze-ibe-ya, nāgaghi-ebu uzọ nọdu ala b͕a ìzù ma ọ puru ichi orú nnù ndi-agha na nnù ise zute onye chiri ọgu nnù ndi-agha abua na nnù iri bia imegide ya?

32 Ma ọ buru na ọ pughi, mb͕e onye ahu nọ n’ebe di anya ub͕u a, o ziga ndi-ozi, riọ ihe gēweta udo.

33 Ya mere otú a, onye ọ bula nime unu nke nāb͕akutaghi ihe nile o nwere azú, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.

34 Ya mere, nnú di nma: ma asi na ọbuná nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ di utọ?

35 O kwesighi ala ma-ọbu ebe anēkpofu ǹsí-anu: ha nātupu ya n’èzí. Onye nwere nti inu ihe, ya nuru.

Categories
LUK

LUK 15

1 Ma ndi-ọna-utu na ndi-nmehie nile nābiaru Ya nso inu okwu-Ya.

2 Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we nātamu, si Nwoke a nānara ndi-nmehie nke-ọma, nēso kwa ha eri ihe.

3 O we tuara ha ilu a, si,

4 Òle madu di n’etiti unu, nke nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha funariri ya, nke nārapughi ọgu anọ na iri na iteghete ahu n’ọhia, ga so nke furu efu, rue mb͕e ọ gāchọputa ya?

5 Mb͕e ọ chọputaworo ya, we tukwasi ya n’ùbú-ya abua, nāṅuri.

6 Mb͕e ọ biaworo n’ulo, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si ha, Sonum ṅuri ọṅu, n’ihi na achọputawom aturum furu efu.

7 Asim unu, na otú a ọṅu gādi n’elu-igwe n’isi otù onye-nmehie nke nēchèghari, kari n’isi ọgu ndi ezi omume anọ na iri na iteghete, ndi nchèghari nādighi nkpà.

8 Ma-ọbu òle nwanyi nke nwere shilling iri, ọ buru na otù shilling efunari ya, nāmuyeghi oriọna, za ulo-ya, chọsi ike rue mb͕e ọ gāchọputa ya?

9 Mb͕e ọ chọputaworo ya, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si, Sonum ṅuri ọṅu, n’ihi na achọputawom shilling nke funariworom-ri.

10 Asim unu, na otù a ọṅù di n’iru ndi-mọ-ozi Chineke n’isi otù onye-nmehie nke nēchèghari.

11 O we si, Otù nwoke ji umu-ndikom abua:

12 nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri.

13 Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n’ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n’idi ndu nke ila-n’iyì.

14 Ma mb͕e o mefusiri ihe nile, oké unwu siri ike dara n’ala ahu; ya onwe-ya we malite inọ na nkpà.

15 O we ga were onwe-ya rapara n’otù onye nime ndi amuru n’ala ahu; o we ziga ya n’ubi-ya izù ezì.

16 O we nāgu ya iwere mb͕ub͕ọ nke ezì nāta riju afọ-ya: ma ọ dighi onye ọ bula nēnye ya.

17 Ma mb͕e ọ mara onwe-ya ọ si, Ọ̀tutu ndi egoro ọlu ole nke nnam nwebigara ob͕e achicha ókè, ma mu onwem nāla n’iyì n’oké agu n’ebe a!

18 M’gebili jekuru nnam, m’gāsi kwa ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n’iru gi:

19 ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ: mem ka m’di ka otù onye nime ndi nke gi egoro ọlu.

20 O we bilie, biakute nna-ya. Ma mb͕e ọ nọ n’ebe di anya ub͕u a, nna-ya huru ya, o we nwe ọmiko n’aru-ya, b͕a ọsọ, makua ya n’olu, sutu kwa ya ọnu nke-uku.

21 Nwa-ya we si ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n’iru gi: ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ.

22 Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n’aka-ya, na akpukpọ-ukwu n’ukwu-ya:

23 sekputa kwa nwa-ehi azùru azù, b͕ue ya, ka ayi ri kwa, ka obi tọ kwa ayi utọ:

24 n’ihi na nwam nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fururi efu, ewe hu ya. Ha we malite ime ka obi tọ ha utọ.

25 Ma nwa-ya nke-okenye nọ n’ubi: mb͕e ọ nābia ru ulo nso, o we nu olu abù na ite-egwú.

26 O we kpọ otù onye nime ndi nēje ozi ka ọ biakute ya, we jua ya ihe ha bu, bú ihe ndia.

27 O we si ya, Nwa-nne-gi abiawo; nna-gi eb͕uwo kwa nwa-ehi azùru azù, n’ihi na ọ nara ya n’aru-ike.

28 Ma o were iwe, ọ chọghi kwa ibà n’ulo: nna-ya we puta, riọ ya.

29 Ma ọ zara, si nna-ya, Le, ọtutu arọ ndia ka m’bu orù-gi, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula m’rapuru ihe i nyere n’iwu: ma ọ dighi mb͕e ọ bula i nyerem nwa-ewu, ka obi we tọ mu na ndi-eyìm utọ:

30 ma mb͕e nwa-gi nka biara, nke ya na ndinyom ndi nākwa iko ripiara ihe nile i ji biri, i b͕uru nwa-ehi azùru azù nye ya.

31 O we si ya, Nwam, mu na gi nọ mb͕e nile, ihem nile bu kwa nke gi.

32 Ma ayi aghaghi ime ka obi tọ ayi utọ na iṅuri ọṅu: n’ihi na nwa-nne-gi nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fukwara efu, ewe hu ya.

Categories
LUK

LUK 16

1 O we si kwa ndi nēso uzọ-Ya, Otù ọgaranya di, nke nwere onye nāchi èzí-na-ulo-ya; onye a ka eboro n’iru ya na ọ nēmefu ihe o nwere.

2 Ọ we kpọ ya, si ya, Ọ̀ bu gini bu nka nke m’nānu bayere gi? kọrọm akukọ nke ọchichi-èzí-na-ulo-gi; n’ihi na i pughi ichi èzí-na-ulo ọzọ.

3 Onye ahu nke nāchi èzí-na-ulo we kwue n’onwe-ya, si, Gini ka m’gēme, n’ihi na onye-nwem nānapum ọchichi-èzí-na-ulo a? Enweghi m ike igwu ala; ihere iriọ aririọ nēmem.

4 Amaram ihe m’gēme, ka, mb͕e ọ bula agēwepum n’ọchichi-èzí-na-ulo a, ka ha we kpọbatam n’ulo nke aka ha.

5 O we kpọ ndi nile ji onye-nwe-ya ugwọ n’otù n’otù, si onye mbu, Ùgwọ ole ka i ji onye-nwem?

6 Ọ si, Ọgu mb͕é manu ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, nọdu ọsọsọ, de ọgu abua na iri.

7 Mb͕e ahu ọ siri onye ọzọ, Ùgwọ ole ka gi onwe-gi ji kwa? Ọ si, Ọgu mb͕é ọka ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, de ọgu anọ.

8 Onye-nwe-ya we to onye ahu nāchi èzí-na-ulo nke nēme ajọ omume, n’ihi na o mere dika onye nwere uche: n’ihi na umu nke oge a nwere uche n’ebe ọb͕ọ nke aka ha nọ kari umu nke ìhè.

9 Mu onwem nāsi kwa unu, Menu ndi-eyi nye onwe-unu site n’àkù nke ajọ omume; ka, mb͕e ọ bula ọ gāgwu, ka ha we kpọbata unu n’ulo-ikwū ebighi-ebi.

10 Onye kwesiri ka atukwasi ya obi n’ihe dikarisiri ntà kwesi-kwa-ra ka atukwasi ya obi n’oké ihe: onye bu kwa onye ajọ omume n’ihe dikarisiri ntà bu kwa onye ajọ omume n’oké ihe.

11 Ya mere, ọ buru na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n’àkù ajọ omume, ònye gēnye ezi àkù n’aka-unu na ntukwasi-obi idebe?

12 Ọ buru kwa na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n’ihe onye ọzọ nwere, ònye gēnye unu ihe nke aka unu?

13 Ọ dighi onye ọ bula nke nēje ozi nke puru ibu orù nke nna abua: n’ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n’anyá; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.

14 Ma ndi-Farisi, ndi nāhu ego n’anya, nuru ihe ndia nile: ha we me Ya ihe-ọchì.

15 O we si ha, Unu onwe-unu bu ndi nāgu onwe-unu na ndi ezi omume n’anya madu; ma Chineke mara obi-unu: n’ihi na ihe di elu n’etiti madu bu ihe-árú n’anya Chineke.

16 Iwu Chineke na ndi-amuma-Ya di rue oge Jọn: site n’oge ahu anēzisa ozi ọma ala-eze Chineke, madu nile n’otù n’otù were ihe-ike nābà nime ya.

17 Ma ọ ka nfé ka elu-igwe na ala gabiga, kari na otù ihe dikarisiri ntà n’iwu ahu gāda.

18 Nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, nke luru kwa nwanyi ọzọ, ọ nākwa iko: onye nālu nwanyi nke di-ya rapuworo nākwa kwa iko.

19 Ma otù ọgaranya di, o nēyi kwa uwe ododo na ezi ákwà ọcha, ọ nēme kwa ka obi nātọ ya utọ nke-ọma kwa-ubọchi:

20 ma atọb͕ọrọri otù ob͕eye n’ọnu-uzọ-amá-ya, aha-ya bu Lazarọs, nke ọnyá juru ya n’aru,

21 onye ọ nāgu kwa ka ewere irighiri nri nke si na table nke ọgaranya ahu dapu me ka afọ ju ya; e, ọbuná nkita nābia racha ọnyá-ya.

22 O we rue na ob͕eye ahu nwuru, ndi-mọ-ozi we bupu ya ga n’ebe ọ dabere n’obì Abraham: ọgaranya ahu nwukwara, ewe lìe ya.

23 Nime Hedis o we welie anya-ya elu, ebe ọ nọ na nmekpa-aru, ọ hu Abraham n’ebe di anya, na Lazarọs ka ọ dabere n’obì-ya.

24 Ọgaranya ahu we kpọ òkù, si, Nna, Abraham, merem ebere, zite Lazarọs, ka ọ detu ọnu-ọ̀nu nkpisi-aka-ya na miri, we mejua irem; n’ihi na anọm n’aru-ufu nime ire-ọku a.

25 Ma Abraham síri, Nwam, cheta na i nara ezi ihe-gi na ndu-gi, otù ahu Lazarọs narakwara ajọ ihe-ya: ma ub͕u a anākasi ya obi n’ebe a, ma gi onwe-gi nọ n’aru-ufu.

26 Ma n’ihe ndia nile, emewo ka oké olùlù disie ike n’ab͕ata ayi na unu, ka ndi nāchọ isi n’ebe a gabiga ijekuru unu we ghara inwe ike, ka onye ọ bula ghara kwa isi n’ebe ahu gabiga biakute ayi.

27 O we si, Ya mere ariọm gi, nna, ka i ziga ya n’ulo nnam;

28 n’ihi na enwerem umu-nne ise; ka o we dọ ha aka na nti, ka ha onwe-ha ghara ibia kwa n’ebe nmekpa-aru a.

29 Ma Abraham siri, Ha nwere Moses na ndi-amuma; ka ha nuru olu-ha.

30 O we si, É-è, nna Abraham: kama ọ buru na otù onye esite na ndi nwuru anwu jekuru ha, ha gēchèghari.

31 O we si ya, Ọ buru na ha anughi olu Moses na ndi-amuma, agaghi-eme kwa ka ha kweye, asi na otù onye esi na ndi nwuru anwu bilie.

Categories
LUK

LUK 17

1 O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ọ bu ihe nāghaghi ime na ihe di ìche iche nēme ka madu ma n’ọnyà gābia: ma ahuhu gādiri onye ahu, nke ha nēsite n’aka-ya bia.

2 Ọ gakara ya-ri mma ma akwuba ya nkume-igwe-nri n’olu, tubà kwa ya n’oké osimiri, kari na ọ gēme ka otù onye nime ndi ntà ndia ma n’ọnyà.

3 Nēzenu onwe-unu: ọ buru na nwa-nna-gi emehie, bara ya nba; ọ buru kwa na ọ chègharia, b͕aghara ya.

4 Ọ buru kwa na o mehiere megide gi ub͕ò asa n’otù ubọchi, we chigharia ọzọ n’ebe i nọ ub͕ò asa, si, Echègharim; i gāb͕aghara ya.

5 Ndi-ozi-Ya we si Onye-nwe-ayi, Tukwasiri ayi okwukwe.

6 Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n’oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti.

7 Ma ònye n’etiti unu, asi na o nwere orù nke nālu ọlu ubi ma-ọbu nke nāzù aturu, gāsi ya, mb͕e o si n’ubi bata n’ulo, Bia ngwa ngwa nọdu na nri;

8 nke nāgaghi-asi kwa ya kama nke ahu, Dozie ihe m’gēri na nri-anyasi, ke kwa ihe-ọkiké n’úkwù-gi, nējerem ozi, rue mb͕e m’risiri ṅu kwa; ma emesia gi onwe-gi gēri ṅu kwa?

9 Ọ̀ nwere ekele n’ebe orù ahu nọ n’ihi na ọ mere ihe akaworo àkà?

10 Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gēmesi ihe nile akaworo àkà nye unu, sinu, Ayi bu orù ndi nābaghi n’ihe; ayi emewo ihe ayi ji ugwọ ime.

11 O rue, mb͕e ha nāga Jerusalem, na Ya onwe-ya nāgabiga n’etiti Sameria na Galili.

12 Mb͕e Ọ nābà n’otù obodo ntà, ndikom iri, bú ndi-ekpenta, we zute Ya, ndi guzoro n’ebe di anya:

13 ha we welie olu-ha elu, si, Jisus, Nna-ayi, mere ayi ebere.

14 Mb͕e Ọ huru ha, O we si ha, Ganu, were onwe-unu gosi ndi-nchu-àjà. O we rue, mb͕e ha nāga, na emere ka aru-ha di ọcha.

15 Ma otù onye n’etiti ha, mb͕e ọ huru na emere ka aru di ya ike, ọ laghachi, were oké olu nenye Chineke otuto;

16 o we da kpuchie iru-ya n’ala n’ukwu-Ya, nēkele Ya: onye ahu bu kwa onye Sameria.

17 Ma Jisus zara, si, Èmeghi ka aru ndikom iri ahu di ọcha? ma òle ebe iteghete fọduru no?

18 Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a?

19 O we si ya, Bilie, ga nke gi: okwukwe-gi azọputawo gi.

20 Ma mb͕e ndi-Farisi juru Ya mb͕e ala-eze Chineke gābia, Ọ zara ha, si, Ala-eze Chineke adighi-abia mb͕e madu nēche nche:

21 ha agaghi-asi kwa, Le, n’ebe a! ma-ọbu, N’ebe ahu! n’ihi na le, ala-eze Chineke di n’etiti unu.

22 O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ubọchi gāba, mb͕e agu ihu otù nime ubọchi Nwa nke madu gāgu unu, ma unu agaghi-ahu ya.

23 Ha gāsi kwa unu, Le, n’ebe ahu! Le, n’ebe a! unu ejela, unu esokwala ha:

24 n’ihi na dika àmùmà, mb͕e ọ nēb͕u àmùmà site n’otù akuku n’okpuru elu-igwe, ọ nēnwu rue akuku ọzọ n’okpuru elu-igwe; otú a ka Nwa nke madu gādi n’ubọchi-Ya.

25 Ma Ọ ghaghi ibu uzọ hu ọtutu ahuhu, aghaghi kwa iju Ya site n’ọb͕ọ a.

26 Ma dika emere n’ubọchi Noa, otú a ka ọ gādi kwa n’ubọchi Nwa nke madu.

27 Ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nālu nwunye, anēnye ha n’ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n’ub͕ọ-ya, oké iju-miri ahu we bia, la ha nile n’iyì.

28 Otú ahu dika emere n’ubọchi Lot; ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nāzú, ha nēre, ha nāku ihe n’ubi, ha nēwu ulo;

29 ma n’ubọchi Lot siri na Sọdọm puta ọku na brimstone si n’elu-igwe zò, we la ha nile n’iyì:

30 n’otù aka ahu ka ọ gādi n’ubọchi agēkpughe Nwa nke madu.

31 N’ubọchi ahu, onye gānọ n’elu ulo, ma ihe-ya di nime ulo, ya ghara iridata ikwapu ha: otú ahu onye nọ kwa n’ubi, ya ghara ilaghachi.

32 Chetanu nwunye Lot.

33 Onye ọ bula nke gāchọ uzọ izutara onwe-ya ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya gēme ya ka ọ di ndu.

34 Asim unu, N’abali ahu madu abua gādi n’elu otù ihe-ndina; agēwere otù nime ha, rapu ibe-ya.

35 Ndinyom abua ganēgwekọ nri n’otù ebe; agēwere otù nime ha, ma agārapu ibe-ya.

36 Madu abua gāno kwa n’ubi; agēwere otù rapu kwa ibe-ya.

37 Ha we za, si Ya, Òle ebe, Onye-nwe-ayi? Ọ si ha, Ebe ozu di, n’ebe ahu ka udele gēzukọ kwa.

Categories
LUK

LUK 18

1 O we turu ha ilu izí ha na ha aghaghi ikpe ekpere mb͕e nile, na ighara ikwe ka ike gwu ha;

2 si, Otù onye-ikpé nọ n’otù obodo, onye nādighi-atu egwu Chineke, nke nādighi-asọpuru kwa madu:

3 otù nwanyi nke di-ya nwuru nọ kwa n’obodo ahu; nwanyi ahu we nābiakute ya, nāsi, Kpeputam n’aka onye-irom.

4 Ma na mbu ọ chọghi ime ya: ma emesia ọ siri n’onwe-ya, Ọ bu ezie na adighi m-atu egwu Chineke, adighm-asọpuru kwa madu;

5 ma n’ihi na nwanyi a di-ya nwuru nēsobum, m’gēkpeputa ya, ka ọ ghara ime ka ike gwusiam site n’ọbibia ọ nābia mb͕e nile.

6 Onye-nwe-ayi we si, Nurunu ihe onye-ikpé nke nēme ajọ omume kwuru.

7 Ma Chineke, Ọ̀ gaghi-ekpeputa ndi nke Ya arọputara, ndi nākpọku Ya ehihie na abali, O nwe-kwa-ra ogologo ntachi-obi n’ebe ha nọ?

8 Asim unu, na Ọ gēkpeputa ha ọsọsọ. Otú ọ di, mb͕e Nwa nke madu gābia, Ọ̀ gāhu okwukwe n’elu uwa?

9 O we tu kwa ilu a nye ufọdu ndi tukwasiri obi n’onwe-ha na ha bu ndi ezi omume, ndi kpọkwara ndi nile fọduru ihe-efu:

10 Ndikom abua rigoro n’ulo uku Chineke ikpe ekpere; otù nime ha bu onye-Farisi, ibe-ya bu onye-ọna-utu.

11 Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n’etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a.

12 Anamebu ọnu ub͕ò abua n’ízù ubọchi asa; anamenye otù uzọ n’uzọ iri n’ihe nile, ka ha ra, bú nke m’natara.

13 Ma onye-ọna-utu ahu guzoro n’ebe di anya, ọ chọghi kwa iweli ọbuná anya-ya le elu-igwe, kama ọ nēti aka n’obi-ya, si, Chineke, ka obi-Gi juru n’ebe mu, bú onye-nmehie, nọ.

14 Asim unu, Nwoke a ridara n’ulo-ya buru onye aguworo n’onye ezi omume kari ibe-ya: n’ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.

15 Ha we kutakwara Ya umu ọhu ha, ka O we metu ha aka: ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, ha bara ha nba.

16 Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n’ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a.

17 N’ezie asim unu, Onye ọ bula nke nāgaghi-anara ala-eze Chineke dika nwatakiri, ọ gaghi-abà nime ya ma-ọli.

18 Otù onye-isi we jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m’gēme ka m’we keta ndu ebighi-ebi?

19 Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke.

20 I matawo ihe nile enyere n’iwu, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Sọpuru nna-gi na nne-gi.

21 Ma ọ siri, Ihe ndia nile ka m’ribara ama site n’okorọbia.

22 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ya, Otù ihe fọdu-kwa-ra gi ime: re ihe nile, ka ha ra, bú nke i nwere, kenye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n’elu-igwe: bia kwa, som.

23 Ma mb͕e ọ nuru ihe ndia, o wutara ya nke-uku; n’ihi na ọ bu oké ọgaranya.

24 Ma ebe Jisus huru ya, Ọ si, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n’ala-eze Chineke!

25 N’ihi na ọ dikariri kamel nfé isite n’anya àgìgá ba nime, kari ọgaranya ibà n’ala-eze Chineke.

26 Ma ndi nuru ya siri, Ònye kwa ka apuru izọputa?

27 Ma Ọ siri, Ihe anāpughi ime n’ebe madu nọ apuru ime n’ebe Chineke nọ.

28 Pita we si, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile nke aka ayi, we so Gi.

29 O we si ha, N’ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu nwunye, ma-ọbu umu-nne, ma-ọbu ndi muru ya, ma-ọbu umu, n’ihi ala-eze Chineke,

30 nke nāgaghi-anata kari ọtutu ihe n’oge a, nata kwa ndu ebighi-ebi n’oge nke nābia.

31 O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya, si ha, Le, ayi nārigoro Jerusalem, ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ site n’aka ndi-amuma gēmezu n’ebe Nwa nke madu nọ.

32 N’ihi na agārara Ya nye n’aka ndi mba ọzọ, me kwa Ya ihe-ọchì, me kwa Ya ihe-ihere, busa kwa Ya ọnu-miri:

33 ha gāpia kwa Ya ihe, b͕ue Ya: n’ubọchi nke-atọ Ọ gēsi kwa n’ọnwu bilie.

34 Ma ndi ahu aghọtaghi ihe ọ bula n’ihe ndia; ezonari-kwa-ra ha okwu a, ha amaghi kwa ihe anēkwu.

35 O rue, mb͕e Ọ nābiaru Jeriko nso, otù onye-ìsì nānọdu n’akuku uzọ nāriọ aririọ:

36 ma ebe ọ nuru ùzù ìgwè madu ka ha nāgabiga, ọ jua isi ihe a.

37 Ha we kọrọ ya, na Jisus Onye Na-zaret nāgabiga.

38 O we tie nkpu, si, Jisus, Nwa Devid, merem ebere.

39 Ndi bu uzọ ga we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma onye ahu tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere.

40 Jisus we guzo, si ka eduru ya biakute Ya: ma mb͕e ọ biara nso, Ọ jua ya, si,

41 Gini ka i nāchọ ka M’mere gi? Ọ́ si, Onye-nwe-ayi, ka eme ka m’hu uzọ.

42 Jisus we si ya, Ka eme ka i hu uzọ: okwukwe-gi azọputawo gi.

43 Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya, nēnye Chineke otuto: ndi-Ju nile, mb͕e ha huru ya, ha we to Chineke.

Categories
LUK

LUK 19

1 O we ba na Jeriko nāgabiga kwa n’etiti ya.

2 Ma le, otù nwoke anākpọ aha-ya Zakiọs; onye ahu bu kwa onye-isi-ọna-utu, onye ahu bu kwa ọgaranya.

3 O we chọ uzọ ihu Jisus imata onye Ọ bu; ma ọ pughi n’ihi ìgwè madu, n’ihi na o toghi ogologo.

4 O we b͕a ọsọ ga n’iru, we rigo n’osisi sycomore ka ọ hu Ya anya: n’ihi na Ọ gaje igabiga n’uzọ ahu.

5 Mb͕e Jisus biaruru ebe ahu, O we le anya n’elu, si ya, Zakiọs, me ngwa, ridata; n’ihi na aghaghi m inọdu n’ulo-gi ta.

6 O we me ngwa, ridata, were kwa ọṅù kpọbata Ya.

7 Mb͕e ha huru ya, ha nile we nātamu, si, Ọ bàra inọ ọnọdu-abali n’ulo nwoke bu onye-nmehie.

8 Zakiọs we guzọ, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m’nwere ka m’gēnye ndi-ob͕eye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n’ebubo ugha, m’gēnyeghachi anọ anọ.

9 Jisus we si ya, Ta ka nzọputa biaruru ulo a, ebe ya onwe-ya bu kwa nwa Abraham.

10 N’ihi na Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu.

11 Ma mb͕e ha nānu ihe ndia, Ọ tukwasi tu ilu, n’ihi na Ọ nọ Jerusalem nso, na n’ihi na ha nēchè na ala-eze Chineke gaje iputa ìhè ngwa ngwa.

12 Ya mere Ọ siri, Otù nwoke amazuru aha-ya gara ala di anya, inara ala-eze nye onwe-ya, na ilaghachi.

13 O we kpọ madu iri nime ndi-orù-ya, nye ha ọgu pound abua na iri, si ha, Zuanu ahia rue mb͕e m’gābia.

14 Ma ndi-obodo-ya kpọrọ ya asì, ha we zìe ndi-ozi ga n’azu ya, si, Ayi achọghi ka nwoke a buru eze-ayi.

15 O we rue, mb͕e ọ laghachiri ọzọ, mb͕e ọ natasiri ala-eze-ya, na ọ siri ka akpọ ndi-orù ahu, ndi ọ nyereri ego ahu, ka ha biakute ya, ka o we mara ihe ha zutarari n’ahia.

16 Onye mbu we bia n’iru ya, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù ọgu pound abua na iri.

17 Ọ we si ya, I mere nke-ọma, ezi orù: n’ihi na ahuru na i kwesiri ka atukwasi gi obi n’ihe dikarisiri ntà, gi buru onye nāchi obodo iri.

18 Nke-abua we bia, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù orú pound na ise.

19 O we si kwa nwoke a, Gi onwe-gi buru kwa onye-isi nke obodo ise.

20 Orù nke di iche we bia, si, Onye-nwe-ayi, le pound ise nke gi, nke m’debere n’ákwà:

21 n’ihi na aturum gi egwu, n’ihi na i bu onye aka ike: i nēweli ihe i nātọb͕ọghi, i nēwe kwa ihe n’ebe ikọghi.

22 Ọ si ya, M’gēsite n’ọnu nke gi kpe gi ikpé, ajọ orù. I mara na mu onwem bu onye aka ike, nēweli ihe m’nātọb͕ọghri, nēwe kwa ihe m’nāghaghri;

23 n’ihi gini kwa ka i nējighi were egom nye ndi nāb͕anwe ego, mu onwem gānara kwa ya na uma mb͕e m’biara?

24 O we si ndi guzoro nso, Napunu ya pound ise ahu, were ha nye onye nwere ọgu pound abua na iri ahu.

25 Ha we si ya, Onye-nwe-ayi, o nwere ọgu pound abua na iri.

26 Asim unu, na onye ọ bula nke nwere ka agēnye; ma onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

27 Otú ọ di, ndi-irom ndia, ndi nāchọghi ka m’buru eze-ha, kuta ha n’ebe a, b͕ue ha n’irum.

28 Mb͕e O kwusiri okwu ndia, O we nāga n’iru, nārigoro Jerusalem.

29 O rue, mb͕e Ọ biaruru Betfagi na Betani nso, n’uzọ ugwu anākpọ ugwu Olive, na O zigara madu abua n’etiti ndi nēso uzọ-Ya,

30 si, Jenu n’obodo ntà nke di na ncherita-iru unu; mb͕e unu nābà, unu gāhu nime ya nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasigh: tọpunu ya, sekputa ya.

31 Ọ buru kwa na onye ọ bula ajua unu, si, N’ìhi gini ka unu nātọpu ya? unu gāsi otú a, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà.

32 Ndi ezigara we je, hu dika Ọ gwara ha.

33 Ma mb͕e ha nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu, ndi-nwe-ya we si ha, Gini mere unu nātopu nwa-inyinya-ibu ahu?

34 Ha we si, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà.

35 Ha we sekputa ya nye Jisus: ha we wukwasi uwe-ha na nwa-inyinya-ibu ahu, we tukwasi Jisus na ya.

36 Mb͕e Ọ nāga, ha we tusa uwe-ha n’uzọ.

37 Ma mb͕e Ọ nābiaru Jerusalem nso ub͕u a, n’uzọ nrida nke ugwu Olive, ọra ndi nile nēso uzọ-Ya malitere iṅuri ọṅu na iwere oké olu to Chineke n’ihi ọlu nile di ike nke ha hururi;

38 si, Onye agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n’aha Onye-nwe-ayi bu: udo di n’elu-igwe, otuto di kwa n’ebe kachasi ihe nile elu.

39 Ufọdu n’etiti ndi-Farisi we si n’ìgwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, bara ndi nēso uzọ-Gi nba.

40 O we za, si, Asim unu na, ọ buru na ndia ekpuchi ọnu-ha, nkume gēti nkpu.

41 Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá,

42 si, Ọ buru na i mara n’ubọchi a, ọbuná gi onwe-gi, ihe gēweta udo! ma ub͕u a ezonariri ha n’anya-gi.

43 N’ihi na ubọchi gābiakwasi gi, mb͕e ndi-iro-gi gēgwu ékpè na ìgá imegide gi, nọgide kwa gi gburugburu, jigide kwa gi n’akuku nile,

44 tuda kwa gi n’ala, na umu-gi bi nime gi; ha agaghi-arapu kwa nime gi otù nkume n’elu nkume-ibe-ya; n’ihi na i maghi oge nleta-gi.

45 O wee ba n’ulọ uku Chineke, malite ichupu ndi nēre,

46 nāsi ha, Edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Ulom gābu kwa ulo ekpere: ma unu onwe-unu mere ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.

47 O we nēzí ihe kwa-ubọchi n’ulo uku Chineke. Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi nke ndi-Ju nāchọ uzọ ila Ya n’iyì:

48 ha ahughi kwa ihe ha gēme; n’ihi na ndi-Ju nile nọ Ya nso gburugburu, nānu okwu-Ya.

Categories
LUK

LUK 20

1 O we rue, n’otù nime ubọchi ahu, mb͕e Ọ nēzí ndi-Ju ihe n’ulo uku Chineke, nēzì kwa ozi ọma, na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, ha na ndi-okenye, we guzo Ya nso;

2 ha we kwue, si Ya, Gwa ayi: Ọ̀ bu n’aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye ka ọ bu, bú onye nyere Gi ike a?

3 Ma Ọ zara, si ha, Mu onwem gāju kwa unu otù ajuju unu zakwam:

4 Baptism nke Jọn, ò sitere n’elu-igwe, ma-ọbu na o sitere n’aka madu?

5 Ha we kwurita n’etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n’elu-igwe; Ọ gāsi, N’ìhi gini ka unu nējighi kwe ya?

6 Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n’aka madu; ndi-Ju nile gēji nkume tub͕u ayi: n’ihi na emewo ka ha kweye na Jọn bu onye-amuma.

7 Ha we za, si na ha amataghi ebe o sitere.

8 Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M’ji eme ihe ndia.

9 O we malite ituru ndi-Ju ilu a: Otù onye kuru ubi-vini, were kwa ya tiye n’aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ nọdu oge di anya.

10 N’oge ighọ nkpuru o we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù, ka ha we nye ya nkpuru ufọdu nke ubi-vine ahu: ma ndi-ọlu-ubi ahu piara ya ihe, zilaga ya n’aka efu.

11 O we zikwasi orù ọzọ: ha we pia kwa ya ihe, me ya ihe-ihere, zilaga ya n’aka efu.

12 O we zikwasi orù nke-atọ: ha we meru kwa onye ahu aru, we tupu ya.

13 Onye-nwe ubi-vine ahu we si, Gini ka m’gēme? m’gēziga ọkparam m’huru n’anya: eleghi anya ha gāsọpuru nwam nka.

14 Ma mb͕e ndi-ọlu-ubi ahu huru ya, ha kwurita n’etiti onwe-ha, si, Nka bu onye-nketa: ka ayi b͕ue ya, ka ihe-nketa-ya we buru nke ayi.

15 Ha we tupu ya n’azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme ha?

16 Ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n’iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. Ma mb͕e ha nuru ya, ha si, Chineke ekwela.

17 Ma O lere ha anya, si, Gini kwa bu ihe a nke edeworo n’akwukwọ nsọ,

Nkume nke ndi nēwu ulo juru,

Nke ahu ka emere isi nkuku ulo?

18 Agētiwasi onye ọ bula nke dakwasiri nkume ahu; ma onye ọ bula ọ gādakwasi ya, ọ gēfesa ya ka uzuzu.

19 Ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi-nchu-àjà we chọ uzọ itukwasi Ya aka n’otù oge hour ahu; ma ha turu egwu ndi-Ju: n’ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha.

20 Ha we che Ya nche, we zipu ndi-nledo, ndi mere onwe-ha dika ndi ezi omume, ka ha we jide Ya n’okwu-ọnu-Ya, irara Ya nye n’aka ọchichi na ike nke onye-isi.

21 Ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I nēkwu nēzi kwa ihe ziri ezi, na I dighi-ele kwa madu anya n’iru, kama I nēzí uzọ Chineke n’ezi-okwu:

22 Ò ziri ezi n’iwu ka ayi tu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi?

23 Ma Ọ matara aghughọ-ha, we si ha,

24 Gosinum otù shilling. Ònyinyo na ihe-ndekwasi nke onye ka o nwere? Ha si, Nke Sisa.

25 O we si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.

26 Ha enweghi kwa ike ijide okwu-Ya n’iru ndi-Ju: ọziza-Ya we ju ha anya, ha we kpuchie ọnu-ha.

27 Ufọdu n’etiti ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n’ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya,

28 si, Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, na ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, mb͕e o nwere nwunye, ma onye ahu enweghi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.

29 Ya mere, umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nēnweghi nwa;

30 nke-abua kwa;

31 nke-atọ we kuru ya; otú ahu ha asa arapughi umu, we nwua.

32 Mb͕e ha nile nwusiri nwanyi ahu nwukwara.

33 Ya mere, na nbilite-n’ọnwu nwùnye onye n’etiti ha ka ọ gābu? n’ihi na ha asa nwere ya na nwunye.

34 Jisus we si ha, Umu nke oge a nālu nwunye, anēnye kwa ha n’ọlulu-di:

35 ma ndi aguru na ha kwesiri iru oge ahu, na iru nbilite-n’ọnwu ahu, bú isi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n’ọlulu-di:

36 n’ihi na ha apughi kwa inwu ọzọ: n’ihi na ha na ndi-mọ-ozi ra; ha bu kwa umu Chineke, ebe ha bu umu nbilite-n’ọnwu ahu.

37 Ma ọbuná Moses gosiri na anēme ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie, nēkwu nime ebe edere okwu bayere Osisi ntà, mb͕e ọ nākpọ Onye-nwe-ayi Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob.

38 Ma Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: n’ihi na ọ bu n’ebe Ọ nọ ka madu nile di ndu.

39 Ufọdu n’etiti ndi-ode-akwukwọ we za, si, Onye-ozizí, I kwuru nke-ọma.

40 N’ihi na ha enweghi anya-ike ọzọ iju Ya ajuju ọ bula.

41 O we si ha, Hà si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid?

42 N’ihi na Devid onwe-ya nēkwu n’akwukwọ Abù ọma, si,

Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,

Nọdu ala n’aka-nrim,

43 Rue mb͕e M’gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.

44 Ya mere, Devid nākpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si kwa aṅa buru Nwa-ya?

45 Ma mb͕e ndi-Ju nile nānu okwu-Ya Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,

46 Nēzenu ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n’uwe-nwuda, ndi nāhu kwa ekele n’ọma-ahia nile unu n’anya, na isi oche nile n’ulo-nzukọ nile unu, na isi ọnọdu n’oriri nile unu;

47 ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, ndi nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya: ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpé gabigara ókè kari ndi ọzọ.