Categories
LUK

LUK 1

1 Ebe ọtutu madu tinyere aka-ha ide akwukwọ banyere ihe ahu nke emezuworo n’etiti ayi,

2 ha dere ihe ndi mbu ji anya ha hu ihe ndia burukwa ndi na-ekwuputa ozioma, gwara ayi,

3 ọ di-kwa-ram nma, ebe m’soro ihe nile nke-ọma site na mbu, ka m’dere gi ka o si me, Teọfilọs di oké ebube;

4 ka i we mata na ihe nile ejiworo okwu ọnu zí gi bu ihe kwesiri itukwasi obi.

5 N’ubọchi Herod, eze Judia, otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n’òtù obodo Abaija puta: o nwe-kwa-ra nwunye nke si n’etiti umu-nwanyi Eron puta; aha nwayi ahu bu Elizabet.

6 Ha abua bu ndi ezi omume n’iru Chineke, nāga n’ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n’iwu na n’ihe nile Ọ guru n’ihe ziri ezi nādighi ita uta.

7 Ha ejighi kwa nwa, n’ihi na Elizabet bu nwanyi-àgà, ha abua aghọwo kwa agadi.

8 Ma o rue, mb͕e ọ nālu ọlu nchu-àjà n’iru Chineke dika ha si-eme kwa ubochi,

9 dika omume ọlu nchu-àjà nādi, ọlu ibà n’ulo nsọ nke Onye-nwe-ayi na isure ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ ruru ya site n’ife nzà.

10 Ọra ndi-Ju nile nēkpe kwa ekpere n’èzí n’oge hour isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

11 Ewe me ka ọ hu mọ-ozi Onye-nwe-ayi ka o guzoro n’aka-nri ebe-ichu-àjà ebe a na-eme ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

12 Mb͕e Zakaraias huru ya obi we lọ ya miri, ọ tu-kwa-ra egwu.

13 Ma mọ-ozi ahu siri ya, Atula egwu, Zakaraias: n’ihi na a nuwo aririọ-gi, nwunye-gi Elizabet gāmu-kwa-ra gi nwa-nwoke, i gākpọ kwa aha-ya Jọn.

14 I gēnwe kwa ọṅù na obi-utọ; ọtutu madu gāṅuri kwa ọṅu n’ọmumu-ya.

15 N’ihi na ọ gābu onye uku n’anya Onye-nwe-ayi, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n’anya ma-ọli; agēme kwa ka o juputa na Mọ Nsọ, ọbuná site n’afọ nne-ya.

16 Ọtutu madu nime umu Israel ka ọ gēme kwa ka ha chigharikwute Onye-nwe-ayi Chineke-ha.

17 Ya onwe-ya gāga kwa n’iru Ya nime mọ na ike Elaija, ime ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ime kwa ka ndi nānughi ihe chigharia iga n’uche ndi ezi omume; idozi nye Onye-nwe-ya otù ndi nke akwadebeworo Ya.

18 Zakaraias we si mọ-ozi ahu, Òle ihe m’gēji mara nka? n’ihi na mu onwem bu agadi, nwunyem aghọwo kwa agadi.

19 Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mu onwem bu Gebriel, onye nēguzo n’iru Chineke; ezite-kwa-ram igwa gi okwu, na izì gi ozi ọma ndia.

20 Le kwa, i gēkpuchi ọnu, i gaghi-apu kwa ikwu okwu, rue ubọchi ahu mb͕e ihe ndia gēme, n’ihi na i kweghi okwum ndia, nke gēmezu n’oge-ha.

21 Ndi-Ju we nēle anya Zakaraias, o ju-kwa-ra ha anya n’ebe ọ nānọ ọdù n’ulo nsọ.

22 Ma mb͕e ọ putara, ọ pughi igwa ha okwu: ha we mara na ọ hururi ọhù n’ulo nsọ: ya onwe-ya we nēfere ha aka, nānọgide kwa n’ob͕i.

23 O we rue, mb͕e ubọchi ifè-òfùfè-ya zuru, na ọ lara n’ulo-ya.

24 Ma mb͕e ubọchi ndia gasiri Elizabet nwunye-ya turu ime; o we zobe onwe-ya ọnwa ise, si,

25 Otú a ka Onye-nwe-ayi meworo nyem n’ubochi O ji lem anya, iwepu ita-utam n’etiti madu.

26 Ma n’ọnwa nke isi ezigara mọ-ozi ahu, bú Gebriel, site n’ebe Chineke nọ je obodo nke Galili, anākpọ aha-ya Nazaret,

27 jekuru nwa-ab͕ọghọ nā-maghi nwoke, onye ekwere na otù nwoke si n’ulo Devid puta, onye aha-ya bu Josef, gālu ya; aha nwa-ab͕ọghọ ahu bu Meri.

28 O we bata n’ebe ọ nọ, si, Ekele, gi onye Chineke meworo ka i nara amara, Onye-nwe-ayi nọyere gi.

29 Ma obi lọrọ ya miri nke-uku n’okwu-ya, o we nātule n’uche-ya aha ekele okwu a gābu.

30 Mọ-ozi ahu we si ya, Atula egwu, Meri: n’ihi na Chineke mere gi amara.

31 Le kwa, i gāturu ime, muta Nwa-nwoke, kpọ aha-Ya Jisus.

32 Nwa-nwoke ahu gābu onye uku, agākpọ kwa Ya Ọkpara nke Onye kachasi ihe nile elu: Onye-nwe-ayi Chineke gēnye kwa Ya oche-eze nna-Ya Devid:

33 Ọ gābu kwa eze ulo Jekob rue mb͕e ebighi-ebi; ala-eze-Ya agaghi-agwu kwa agwu.

34 Meri we si mọ-ozi ahu, Ìhe a gēsi aṅa me, ebe ọ dighi nwoke m’mara?

35 Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n’ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke.

36 Le kwa, Elizabet onye-ikwu-gi, ya onwe-ya aturuwo kwa ime nwa-nwoke n’agadi-ya: nke a bu kwa ọnwa nke-isi ya, bú onye anākpọ nwanyi-àgà.

37 N’ihi na ọ dighi okwu ọ bula si Chineke n’ọnu puta nke nāgaghi-adi irè.

38 Meri we si, Le, abum orù-nwanyi nke Onye-nwe-ayi; ya dirim ka okwu-gi si di. Mọ-ozi ahu we pua n’ebe ọ nọ.

39 Ma Meri biliri na mb͕e ahu, ga elu-ala ọsọsọ, bà n’otù obodo nke Juda;

40 we ba n’ulo Zakaraias, kele kwa Elizabet.

41 O we rue, mb͕e Elizabet nuru ekele Meri, nwa-ya wuliri n’afọ-ya; Elizabet we juputa na Mọ Nsọ;

42 o we welie olu-ya tisie nkpu ike, si, Gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi n’etiti ndinyom, ọ bu kwa onye agọziri agọzi ka nkpuru nke afọ-gi di.

43 Òle ebe ka nka si kwa rum, na nne Onye-nwem gābiakutem?

44 N’ihi na lee, mb͕e olu ekele-gi ruru na ntim, nwam wuliri n’afọm n’obi-utọ.

45 Ngọzi nādi-kwa-ra nwanyi ahu nke kwere na ihe ndia gēmezu, bú nke agwaworo ya site n’ọnu Onye-nwe-ayi.

46 Meri we si,

Nkpuru-obim nēme ka Onye-nwe-ayi di uku,

47 Ọ nātọ kwa mọm utò nke-uku na Chineke, bú Onye-nzọputam.

48 N’ihi na O lere ọnọdu di ala nke orù-Ya nwanyi anya:

N’ihi na le, site n’ub͕u a ọb͕ọ nile gākpọm onye ngọzi diri.

49 N’ihi na Onye di ike emewom ihe uku di iche iche;

Aha-Ya di kwa nsọ.

50 Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nātu egwu Ya

Rue ọb͕ọ na ọb͕ọ.

51 O werewo ogwe-aka-Ya gosi ike;

Ọ chusawo ndi-npako n’èchìchè nke obi-ha.

52 O wedawo ndi di ike pua n’oche-eze-ha,

Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala.

53 O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ;

Zipu kwa ndi-ọgaranya n’aka efu.

54 O nyeworo Israel nwa-Ya aka,

Ka O we cheta ebere

55 (Dika Ọ gwara nna-ayi-hà)

N’ebe Abraham na nkpuru-ya nọ rue mb͕e ebighi-ebi.

56 Meri we nọyere ya ihe dika ọnwa atọ, we laghachi n’ulo-ya.

57 Ma oge Elizabet zuru ka ọ gāmuta nwa; o we mua nwa-nwoke.

58 Ndi-ab͕ata-obi-ya na ndi-ikwu-ya we nu na Onye-nwe-ayi mere ka ebere-Ya di uku n’ebe ọ nọ; ha we so ya ṅuri ọṅu.

59 O we rue n’ubọchi nke-asato, na ha biara ibi nwatakiri ahu úgwù; ha we kpọbá ya Zakaraias, n’aha nna-ya.

60 Nne-ya we za, si, mba; kama agākpọ ya Jọn.

61 Ha we si ya, Ọ dighi onye ọ bula n’etiti ndi-ikwu-gi nke anākpọ aha nka.

62 Ha we fere nna-ya aka, ihe ọ chọrọ ka akpọ ya.

63 O we riọ ha ka ha nye ya ihe eji ede akwukwọ, o we de, si, Aha-ya bu Jọn. O we ju ha nile anya.

64 Ngwa ngwa ọnu-ya we saghe, ire-ya tọpu kwa, o we nēkwu okwu, nāgọzi Chineke.

65 Ndi nile bi ha gburugburu we tua egwu: ewe kwusa okwu ndia nile n’elu-ala Judia dum.

66 Ndi nile nke nuru ha we debe ha n’obi-ha, si, Àha madu gini kwa ka nwatakiri a gābu? N’ihi na aka Onye-nwe-ayi diyere ya.

67 Nna-ya Zakaraias we juputa na Mọ Nsọ, o we bu amuma, si,

68 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye-nwe-ayi, Chineke nke Israel;

N’ihi na O letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra ha ọlu nb͕aputa,

69 O weliwo-kwa-ra ayi mpi nke nzọputa

N’ulo onye nējere Ya ozi, bú Devid

70 (Dika O kwuru site n’ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ site n’oge mbu),

71 Nzọputa n’aka ndi-iro-ayi, na n’aka ndi nile nākpọ ayi asì;

72 Imere nna-ayi-hà ebere,

Na icheta ọb͕ub͕a-ndu nsọ Ya;

73 Iyí Ọ ṅuru Abraham nna-ayi,

74 Ikweye ayi, ebe adọputaworo ayi n’aka ndi-iro-ayi,

Ka ayi nēkpere Ya nātughi egwu.

75 N’obi ọcha na ezi omume n’iru Ya ubọchi-ayi nile.

76 Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi ihe nile elu:

N’ihi na i gāga n’iru Onye-nwe-ayi idozi uzọ-Ya nile;

77 Ime ndi nke Ya ka ha mara nzọputa

Nime nb͕aghara nmehie nile ha,

78 N’ihi obi ebere nke Chineke-ayi,

Nke ọwuwa-anyanwu nke sitere n’elu gēleta ayi nime ya,

79 Imukwasi ndi nọ n’ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè;

Iduzi ukwu-ayi ba n’uzo udo.

80 Nwatakiri ahu we nētọ, nēsi kwa ike na mọ-ya, o we nọ n’ọhia rue ubọchi ewere ya gosi Israel.

Categories
LUK

LUK 2

1 Ma o rue na mb͕e ahu, iwu si n’ebe Sisa Ọgọstọs nọ puta na agēde aha madu nile bi n’elu-uwa dum madu bi n’akwukwo.

2 Nka bu odide-aha mbu edere mb͕e Kwiriniọs bu onye nāchi Siria.

3 Madu nile we ga ka ede aha-ha n’akwukwọ, onye ọ bula ọ ga obodo nke aka ya.

4 Josef we si kwa na Galili, site n’obodo Nazaret, rigo na Judia, ba n’obodo Devid nke anākpọ Betlehem, n’ihi na o si n’ulo na agburu Devid puta;

5 ka o we me ka ede aha ya na Meri n’akwukwọ, bú nwanyi ekwere na ọ gālu, onye di kwa ime.

6 O we rue, mb͕e ha nọ n’ebe ahu, ubọchi-ya zuru ka ọ gāmuta nwa.

7 O we muta Nwa-nwoke mbu ya; o we ke Ya n’ákwà ọkiké, nyibe Ya n’ihe anētiye nri anu-ulo, n’ihi na uzọ adighi nye ha n’ulo ndi-ije.

8 Ndi-ọzùzù-aturu di n’otù ala ahu nānọ n’ọhia, nēche kwa ìgwè aturu-ha n’abali.

9 Mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we guzo ha nso, ebube nke Onye-nwe-ayi muba-kwa-ra ha gburugburu: ha we tua egwu nke-uku.

10 Mọ-ozi ahu we si ha, Unu atula egwu; n’ihi na le, anamezì unu ozi ọma nke oké ọṅù nke gādiri ndi Israel nile:

11 n’ihi na ta n’obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi.

12 Nka gābu-kwa-ra unu ihe-iriba-ama-Ya; Unu gāhu Nwa ọhu ekere n’ákwà ọkiké, nēdina kwa n’ihe anētiye nri anu-ulo.

13 Na mberede ìgwè usu ndi-mọ-ozi nke elu-igwe we nọyere mọ-ozi ahu, nēto Chineke, si,

14 Otuto diri Chineke n’ebe kachasi ihe nile elu,

Udo di kwa n’elu uwa n’etiti madu ndi ihe-ha di Ya ezi nma.

15 O we rue, mb͕e ndi-mọ-ozi puru n’ebe ha nọ la n’elu-igwe, ndi-ọzùzù-aturu we sirita onwe-ha, Ka ayi je rue Betlehem ub͕u a, hu ihe a ekwuru, nke Onye-nwe-ayi mere ka ayi mara.

16 Ha we were ọsọ bia, hu Meri na Josef, na Nwa ọhu ahu ka O dinara n’ihe ahu anētiye nri anu-ulo.

17 Ma mb͕e ha huru ya, ha me ka amara okwu agwara ha-ri bayere Nwatakiri ahu.

18 Okwu ndi-ọzùzù-aturu gwara ha we ju ndi nile nuru ha anya.

19 Ma Meri debere ihe ndia nile ekwuru, nātughari ha n’obi-ya.

20 Ndi-ọzùzù-aturu we laghachi, nēnye Chineke otuto, nēto kwa Ya n’ihi ihe nile ha nuru na nke ha huru, dika agwara ha.

21 Mb͕e ubọchi asatọ zuru ibì Ya úgwù, ewe kpọ aha-Ya Jisus, nke mọ-ozi kpọrọ ya mb͕e akātughi ime Ya.

22 Mb͕e ubọchi nile nke ime ha ka ha di ọcha dika iwu nke Moses si di zuru, ha we kuru Ya rigoro Jerusalem, iche Ya n’iru Onye-nwe-ayi

23 (dika edeworo ya n’iwu Onye-nwe-ayi, Nwa mbu ọ bula nke bu oke nke meghere àkpà-nwa, agākpọ ya ihe nsọ nye Onye-nwe-ayi),

24 na inye ihe-ichu-àjà dika okwu ekwuworo n’iwu Onye-nwe-ayi si di, Nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua.

25 Ma le, otù nwoke nọ na Jerusalem, onye aha-ya bu Simeon; nwoke a bu kwa onye ezi omume na onye nātu egwu Chineke, nēche nkasi-obi nke Israel: Mọ Nsọ di kwa n’aru ya.

26 Mọ Nsọ duru ya-ri ọdu, na ọ gaghi-ahu ọnwu, rue mb͕e ọ gāhu Kraist nke Onye-nwe-ayi.

27 O we bia na Mọ ahu nime ulo uku Chineke: mb͕e ndi muru Ya kubatara Nwatakiri ahu, bú Jisus, ka ha we mere Ya dika omume iwu Chineke si di,

28 ya onwe-ya we nara Ya nke-ọma, kuru Ya n’aka-ya, gọzi kwa Chineke, si,

29 Onye-nwem, ub͕u a ka I gārapu orù-Gi ka ọ la

N’udo, dika okwu-Gi si di;

30 N’ihi na anyam ahuwo nzọputa-Gi,

31 Nke I doziri n’iru ndi nile;

32 Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ,

Na ebube ndi-Gi, bú Israel.

33 Ihe ekwuru bayere Ya we nēju kwa nna-Ya na nne-Ya anya;

34 Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n’Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;

35 ma mma-agha gāduwa kwa nkpuru-obi gi onwe-gi; ka ewe kpughe èchìchè nke si n’ọtutu obi puta.

36 Otù onye anākpọ Ana di kwa, bú onye-amuma-nwanyi, nwa-nwanyi Fanuel, nke si n’ebo Asha puta (nwanyi a aghọwo ezi agadi, ebe ya na di-ya biri arọ asa site na nwa-ab͕ọghọ-ya,

37 o we nọdu n’ọnọdu nwanyi di-ya nwuru rue ọgu arọ anọ na anọ), onye nāpughi n’ulo Chineke, ma o were obubu-ọnu na aririọ nēkpere Chineke abali na ehihie.

38 O we bia rue ebe ahu n’otù oge hour ahu, we kele Chineke, gwa kwa ndi nile nēche nb͕aputa nke Jerusalem okwu bayere Ya.

39 Mb͕e ha mezuru ihe nile nke di ka iwu Onye-nwe-ayi si di, ha we laghachi na Galili, rue obodo nke aka ha, bú Nazaret.

40 Nwatakiri ahu we nētó, nēsi kwa ike, nējuputa n’amam-ihe: amara Chineke di kwa n’aru Ya.

41 Ndi muru Ya nēje Jerusalem kwa-arọ n’ememe ngabiga.

42 Mb͕e Ọ b͕ara arọ iri na abua, ha we rigo dika omume nke ememe ahu si di;

43 mb͕e ha nọzuru ubọchi nile, mb͕e ha nālaghachi, Nwa-okoro ahu, bú Jisus, we nọdu n’azu na Jerusalem; ndi muru Ya amaghi kwa ya;

44 ma ebe ha chère na Ọ di n’usu-ha, ha jere ije otù ubọchi; ha nachọ kwa Ya n’etiti ndi-ikwu-ha na ndi ha mara:

45 mb͕e ha nāchọtaghi Ya, ha we laghachi na Jerusalem, nāchọ Ya.

46 Ọ we rue, mb͕e ubọchi atọ gasiri, ha hu Ya n’ulo Chineke, ka Ọ nọduru n’etiti ndi-ozizí, nānu okwu-ha, nāju kwa ha ajuju:

47 ibobo nghọta-Ya na ọziza nile Ya we nwua ndi nile nuru okwu-Ya n’aru.

48 Mb͕e ha huru Ya, egwu wee tua ha n’aru: nne-Ya we si Ya, Nwam, Gini mere I meso ayi otú a? le, nna-Gi na mu onwem nāchọ Gi n’obi ufu.

49 O we si ha, Gini mere unu nāchọm? ùnu amataghi na aghaghm idi n’ihe nke Nnam?

50 Ma ha onwe-ha aghọtaghi okwu Ọ gwara ha.

51 O we so ha rida, bia rue Nazaret; Ọ we nọdu n’okpuru ha: nne-Ya we nēdebe ihe nile ekwuru n’obi-ya.

52 Jisus we nāga n’iru n’amam-ihe na ogologo, nāga kwa n’amara n’ebe Chineke na madu nọ.

Categories
LUK

LUK 3

1 Ma n’arọ nke-iri-na-ise n’ọchichi nke Taibiriọs Sisa, mb͕e Pọntiọs Pailat bu onye nāchi Judia, mb͕e Herod bu kwa tetrarch nke Galili, mb͕e nwa-nne-ya Filip bu kwa tetrarch nke ala Ituria na Trakonaitis, mb͕e Lisanias bu kwa tetrarch nke Abilini,

2 mb͕e Anas na Kaiafas bu ndi-isi-nchu-àjà, okwu Chineke biakutere Jọn nwa Zakaraias n’ọhia.

3 O we bia n’ala nile di Jọ̀dan gburugburu, nēkwusa baptism nke nchèghari, ka ewe b͕aghara nmehie;

4 dika edeworo ya n’akwukwọ okwu Aisaia onye-amuma, si,

Olu otù onye nēti nkpu n’ọhia, si,

Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi,

Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.

5 Agēkpoju ndagwurugwu ọ bula,

Agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala;

Ebe di nb͕agọ gāghọ kwa ebe guzoziri eguzozi,

Ebe nile di nkputankpu gābu kwa uzọ di lari;

6 Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke.

7 Ya mere ọ si ìgwè madu ahu ndi biara ka ọ me ha baptism, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?

8 Ya mere mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu, unu amalite-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n’ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.

9 Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi kwa anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile; ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.

10 Ìgwè madu ahu we jua ya, si, Ọ̀ bu kwa gini kwesiri ka ayi me?

11 O we za, si ha, Onye nwere uwe-ime abua, ya me onye nēnweghi ka o keta; onye nwekwara nri, ya mee otú ahu.

12 Ndi-ọna-utu biakwara ka eme ha baptism, ha we si ya, Onye-ozizí, gini kwesiri ka ayi me?

13 Ọ si ha, Unu apunarala madu kari ihe akaworo unu.

14 Ndi-agha nēje ozi jukwara ya, si, Ayi onwe-ayi kwa, gini kwesiri ka ayi me? Ọ si ha, Unu ejidela onye ọ bula aka ike, ebokwala onye ọ bula ebubo ugha; ka afọ ju kwa unu n’ego-ọlu-unu.

15 Mb͕e ndi-Ju nọ nēle anya, mb͕e madu nile nātughari kwa n’obi-ha ihe bayere Jọn, ma eleghi anya ya onwe-ya bu Kraist ahu,

16 Jọn zara, si ha nile, Mu onwem nēji miri me unu baptism n’ezie; ma Onye kam ike nābia, Onye m’nērughi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:

17 Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n’aka-Ya, ifuchapu ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, na ikpokọta ọka-Ya n’ọba-Ya; ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.

18 Ya mere o ji ọtutu ndumọdu di iche iche zì ndi-Ju ozi ọma;

19 ma Herod, bú tetrarch, ebe Jọn turu ya nmehie-ya n’anya, bú ihe bayere Herodias nwunye nwa-nna-ya, na ihe bayere ajọ ihe nile Herod mere,

20 ọ tukwasi-kwara nka n’elu ihe nile, na o mechibidoro Jọn n’ulo-nkpọrọ.

21 Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe,

22 Mọ Nsọ we fedakwasi Ya n’oyiyi aru, dika nduru, olu we site n’elu-igwe, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M’huru n’anya; ihe-Gi dim ezi mma.

23 Ma Jisus onwe-ya, mb͕e Ọ malitere izí ihe, Ọ b͕ara ihe dika orú arọ na iri, buru Nwa Josef (dika echère), nwa Hili,

24 nwa Matat, nwa Livai, nwa Melkai, nwa Janai, nwa Josef,

25 nwa Matataias, nwa Emos, nwa Nehum, nwa Esli, nwa Nagai,

26 nwa Meath, nwa Matataias, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda,

27 nwa Joanan, nwa Risa, nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, nwa Nirai,

28 nwa Melkai, nwa Adai, nwa Kosam, nwa Elmadam, nwa Ia,

29 nwa Jisus, nwa Elieza, nwa Jorim, nwa Matat, nwa Livai,

30 nwa Simeon, nwa Judas, nwa Josef, nwa Jonam, nwa Elaiakim,

31 nwa Melea, nwa Mena, nwa Matata, nwa Netan, nwa Devid,

32 nwa Jesi, nwa Obed, nwa Boaz, nwa Salmon, nwa Nahshon,

33 nwa Aminadab, nwa Admin, nwa Anai, nwa Hezron, nwa Perez, nwa Juda,

34 nwa Jekob, nwa Aisak, nwa Abraham, nwa Tira, nwa Nehoa,

35 nwa Serug, nwa Reu, nwa Peleg, nwa Iba, nwa Shela,

36 nwa Kainan, nwa Afaksad, nwa Shem, nwa Noa, nwa Lemek,

37 nwa Metusela, nwa Inok, nwa Jered, nwa Mahalaleel, nwa Kenan,

38 nwa Enos, nwa Set, nwa Adam, nwa Chineke.

Categories
LUK

LUK 4

1 Ma ebe Jisus juputara na Mọ Nsọ, O si na Jọdan laghachi, Mọ ahu we duru Ya nāgaghari n’ọhia,

2 ekwensu nānwà kwa Ya ọgu ubọchi abua. O righi kwa ihe ọ bula n’ubọchi ahu: mb͕e ubọchi ahu zuru, agu we gua Ya.

3 Ekwensu we si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọ ob͕e achicha.

4 Jisus we za ya, si, Edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu.

5 Ọ we duru Ya rigo, we gosi Ya ala-eze nile nke elu-uwa dum madu bi na nkenke oge.

6 Ekwensu we si Ya, Gi ka m’gēnye ike a nile, na ebube-ha: n’ihi na ararawo ya nye n’akam; onye ọ bula m’chọ-kwa-ra inye ya m’nye ya.

7 Ya mere ọ buru na Gi onwe-gi gākpọ isi ala n’irum, ihe a nile gābu nke Gi.

8 Jisus we za, si ya, Edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.

9 O we duru Ya ga Jerusalem, guzo Ya n’elu akuku ulo uku Chineke, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n’ebe a tuda Onwe-gi n’ala:

10 n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi:

11 Ọzọ,

Ọ bu kwa n’elu aka-ha ka ha gēburu gi,

Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya.

12 Jisus we za, si ya, Ekwuwo, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.

13 Mb͕e ekwensu nwasiri ọnwunwa nile, o we si n’ebe Ọ nọ pua rue mb͕e ọzọ.

14 Jisus we laghachi na Galili n’ike Mọ Nsọ: ùdé-Ya we pua jesa n’ala dum di buruburu.

15 Ya onwe-ya we nēzí ihe n’ulo-nzukọ nile ha, madu nile nēnye kwa Ya otuto.

16 O we bia rue Nazaret, ebe azuputara Ya, O we ba n’ulo-nzukọ-ha n’ubọchi-izu-ike, dika Ọ nēme mb͕e dum, O we bilie igu akwukwọ.

17 Ewe nye Ya akwukwọ Aisaia onye-amuma n’aka. Ó we meghe akwukwọ ahu, chọta ebe edeworo ya, si,

18 Mọ nke Onye-nwe-ayi di n’arum.

N’ihi na O terem manu izì ndi-ob͕enye ozi ọma:

O ziteworom ikwusa ọrira gwa ndi adọtara n’agha,

Na ikwusa ihu-uzọ gwa ndi-ìsi,

Izipu ndi etihiawara aru ka ha la,

19 Ikwusa arọ mb͕e Onye-nwe-ayi nānara madu nke-ọma.

20 O we kpuchie akwukwọ ahu, were ya nyeghachi onye nējere ha ozi, we nọdu ala: ndi nile nọ n’ulo-nzukọ ahu we nēlegide Ya anya.

21 O we malite isi ha, Ta ka emezuworo ihe a edeworo n’akwukwọ nsọ na nti-unu.

22 Ha nile we buru ndi-àmà-Ya, okwu nile nke amara nke si n’ọnu-Ya puta nēju kwa ha nile anya: ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Nwa Josef?

23 O we si ha, N’ezie unu gaturu m ilu a, Dibia, me ka aru Gi onwe-gi di ike: ka ihe ayi nuru na emere ha na Kapanaum ra, me kwa otú a n’ebe a n’obodo nke aka Gi.

24 O we si, N’ezie asim unu, Ọ dighi onye-amuma ọ bula nke anara nke-ọma n’obodo nke aka ya.

25 Ma n’ezie ka M’nāsi unu, Ọtutu ndinyom di-ha nwuru di n’ala Israel n’ubọchi Elaija, mb͕e emechiri elu-igwe arọ atọ na ọnwa isi, mb͕e oké unwu dara n’ala ahu nile;

26 ma ọ dighi onye ọ bula nime ha ezigara Elaija, kama nání Zarefat, n’ala Saidon, jekuru nwanyi di-ya nwuru.

27 Ọtutu ndi-ekpenta di kwa n’Israel na mb͕e Elaisha onye-amuma; ma ọ dighi onye ọ bula nime ha emere ka ọ di ọcha, kama nání Neamam onye Siria.

28 Ọnuma we juputa ha nile n’ulo-nzukọ ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia;

29 ha we bilie, chupu Ya n’obodo ahu, duru Ya ga rue mpempe ugwu nke ewuru obodo-ha n’elu ya, ka ha we kwada Ya n’ala.

30 Ma Ya onwe-ya gabigara n’etiti ha la.

31 O we ridata na Kapanaum, otù obodo nke Galili, O we nēzi ha ihe n’ubọchi-izu-ike:

32 ibobo ozizí-Ya we nwua ha n’aru; n’ihi na okwu-Ya di ike.

33 Otù nwoke nọ kwa n’ulo-nzukọ-ha, nke nwere mọ ọjọọ; o we were oké olu tisie nkpu ike, si,

34 pua ebe a! ginl ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n’iyì? amataram, Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke.

35 Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta. Mb͕e mọ ọjọ ahu tudasiri ya n’ala n’etiti ha, o we si nime ya puta, nēmerughi ya aru.

36 Ibobo we nwua ha nile n’aru, ha we kwurita n’etiti onwe-ha, si, Gini bu okwu a? n’ihi na O ji ichi-isi na ike nye ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha we puta.

37 Ùzù-Ya we tua gazue n’ebe nile nke ala di obodo ahu gburugburu.

38 O we si n’ulo-nzukọ ahu bilie, ba n’ulo Saimon. Ma oké aru-ọku jisiri nne nwunye Saimon ike; ha we kpe ekpere banyere ya.

39 O we guzo n’akuku ya, bara aru-ọku ahu nba; aru-ọku ahu we rapu ya: ngwa ngwa o we bilie nēje-kwa-ra ha ozi.

40 Ma mb͕e anyanwu nāda, ndi nile, ka ha ra, bú ndi nwere madu aru nādighi nma n’ọria di iche iche, kuru ha biakute Ya; O we bikwasi ha nile n’otù n’otù aka-Ya abua, me kwa ka aru di ha ike.

41 Ndi-mọ ọjọ puta-kwa-ra n’ọtutu madu, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke. Ma Ọ nābara ha nba, O kweghi kwa ka ha kwue okwu, n’ihi na ha matara na Ya bu Kraist.

42 Ma mb͕e chi bọrọ, Ọ pua ga n’ebe bu ọhia: igwè madu nile we nāchọ Ya, we biakute Ya, malite kwa ib͕ochi Ya, ka Ọ ghara isi na nke ha ga ebe ọzọ.

43 Ma Ọ siri ha, Aghaghm izì kwa obodo nile ọzọ ozi ọma ala-eze Chineke: n’ihi na eziterem ime nka.

44 O nēkwusa kwa okwu Chineke n’ulo-nzukọ nile nke Galili.

Categories
LUK

LUK 5

1 Ma o rue, mb͕e ìgwè madu nādagide Ya nānu kwa okwu Chineke, na Ya onwe-ya nēguzo n’usọ ọdọ-miri Genesaret;

2 O we hu ub͕ọ abua ka ha guzoro n’usọ ọdọ-miri ahu: ma ndi-ọkù esiwori nime ha pua, ha nāsa kwa ihe ha ji eb͕u azù.

3 O we ba n’otù nime ub͕ọ abua ahu, nke bu nke Saimon, we kpere ya ka o si n’ala nupu nke-ntà. O we nọdu, si n’ub͕ọ nēzí ìgwè madu nile ihe.

4 Ma mb͕e O kwubìri okwu, Ọ si Saimon, Nupu n’ob͕u-miri, wunyenu ihe unu ji eb͕u azù ka unu b͕ue azù.

5 Saimon we za, si, Nna-ayi, ayi dọb͕uru onwe-ayi n’ọlu ogologo abali a dum, ma ayi eb͕utaghi ihe ọ bula: ma n’okwu-Gi m’gāwuye ihe eji eb͕u azù.

6 Mb͕e ha mesiri nka, ha we nwuta oké ìgwè azù, ihe-ha eji eb͕u azù we nādọka;

7 ha we fere ndi-nketa-ibe-ha aka, bú ndi nọ n’ub͕ọ-ha ọzọ, ka ha bia nyere ha aka. Ha we bia, b͕ujue ub͕ọ̀ abua ahu, ya mere ha malitere imìkpu.

8 Ma mb͕e Saimon Pita huru ya, o we da n’ala n’ikperè Jisus, si, Si n’ebe m’nọ pua; n’ihi na abum onye-nmehie, Onye-nwe-ayi.

9 N’ihi na ibobo ob͕ub͕u azù ha b͕uru nwuru ya na ndi nile ya na ha nọ n’aru;

10 otú ahu ka ibobo nwu-kwa-ra Jemes na Jọn, umu Zebedi, n’aru, ndi ha na Saimon bu ndi-nnweko. Jisus we si Saimon, Atula egwu; site n’ub͕u a i ganānwuta madu na ndu.

11 Mb͕e ha tinyere ubọ-ha n’ala, ha we rapu ihe nile, so Ya.

12 O rue, mb͕e Ọ nọ n’otù nime obodo ahu, le, otù nwoke nke ekpenta juputara n’aru: ma mb͕e ọ huru Jisus o da kpuchie iru-ya n’ala, riọ Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m’di ọcha.

13 O we setipu aka-Ya, metu ya, si, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya.

14 Ya onwe-ya we nye ya iwu ka ọ ghara igwa onye ọ bula: Ọ si kwa ya, Kama laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n’iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha, dika Moses nyere n’iwu, ka ọ buru ha àmà.

15 Ma okwu bayere Ya fesakariri nke-uku: oké ìgwè madu we nāb͕akọ inu okwu-Ya, ka ewe me kwa aru-ha nke nādighi nma ka ọ di ike.

16 Ma Ya onwe-ya nēwezuga Onwe-ya n’ebe bu ọhia, nēkpe kwa ekpere.

17 O rue n’otù nime ubọchi ahu, na Ya onwe-ya nēzi ihe; ndi-Farisi na ndi-ozizí iwu Moses nānọ kwa Ya nso, ndi siri n’obodo ntà nile nke Galili na Judia na Jerusalem puta: ike nke Onye-nwe-ayi diye-kwa-ra Ya ime ka aru di madu ike.

18 Ma le, ndikom butere otù nwoke akuku-aru-ya nwuru anwu n’elu ihe-ndina: ha we nāchọ uzọ ibubata ya, na itọb͕ọ ya n’iru Ya.

19 Ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi bubata ya n’ihi ìgwè madu ahu, ha we rigo n’elu ulo, we si n’okpukpu ulo buda ya na ute-ya n’etiti n’iru Jisus.

20 Mb͕e Ọ huru okwukwe-ha, Ọ si, Nwoke, ab͕agharawo gi nmehie-gi nile.

21 Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite itule n’obi-ha, si, Ònye bu Nwoke a nke nēkwu okwu nkwulu? Ònye puru ib͕aghara nmehie, ma-ọbughi nání Chineke?

22 Ma ebe Jisus mazuru ihe ha nātule n’obi-ha, Ọ za, si ha, Gini mere unu nātule ihe n’obi-unu?

23 Òle nke ka nfé, isi, Ab͕agharawo gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, jeghari kwa?

24 Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n’elu uwa ib͕aghara nmehie (Ọ si onye ahu ukwu-ya nwuru anwu), M’si gi, Bilie, chiri ute-gi, laa n’ulọ gi.

25 Ngwa ngwa o we bilie n’iru ha, chiri ihe o ji dina, je ulo-ya, nēto Chineke.

26 Ibobo we nwua ha nile n’aru, ha we to Chineke; egwu juputa-kwa-ra ha n’obi, ha si, Ayi ahuwo ihe-ebube ta.

27 Mb͕e ihe ndia gasiri Ọ pua, hu onye-ọna-utu, nke anākpọ aha-ya Livai, ka ọ nọduru n’ulo-ùtú, Ọ si ya, Som.

28 O we rapu ihe nile, bilie, so Ya.

29 Livai we siere Ya nri uku n’ulo-ya iji nara Ya nke-ọma: oké ìgwè ndi-ọna-utu na ndi ọzọ di kwa ndi soro ha nọdu na nri.

30 Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ-ha we tamube imegide ndi nēso uzọ-Ya, si, N’ìhi gini ka unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia nēri ihe?

31 Jisus we za, si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi aru di nma; kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma.

32 Abiaghm ikpọ ndi ezi omume kama ọ bu ndi-nmehie ka ha chègharia.

33 Ha we si Ya, Ndi nēso uzọ Jọn nēbu ọnu ọtutu mb͕e, nāriọ kwa aririọ; otú ahu ka ndi nēso uzọ ndi-Farisi nēme kwa; ma ndi nke Gi nēri nāṅu kwa.

34 Ma Jisus siri ha, Ọ̀ gābu na unu puru ime ka umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu bue ọnu, mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ?

35 Ma ubọchi gābia; mb͕e agānapu kwa ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu ọnu n’ubọchi ahu.

36 O we tu-kwa-ra ha ilu, si, Ọ dighi onye ọ bula nādọkapu iberibe ákwà ọb͕ub͕a n’uwe ọhu tukwasi ya n’uwe ochie; eme otú a, ọ gādọka nke-ọhu, ọzọ kwa, iberibe ákwà ọb͕ub͕a si n’uwe ọhu ahu puta agaghi-adabà na nke-ochie.

37 Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie; eme otú a, manya-vine ọhu gāb͕awa karama-akpukpọ, manya onwe-ya gāwusì, karama-akpukpọ ahu gāla kwa n’iyì.

38 Ma aghaghi ib͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu.

39 Ọzọ kwa, ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ ṅuworo manya-vine ochie, nāchọ nke-ọhu: n’ihi na ọ si, Nke-ochie di nma.

Categories
LUK

LUK 6

1 O rue na Ọ nāga n’etiti ubi ọka n’ubọchi-izu-ike; ndi nēso uzọ-Ya we nāghọ oko ọka, nāta, nāmazu ha n’aka-ha.

2 Ma ufọdu nime ndi-Farisi siri, Gini mere unu nēme ihe nēzighi ezi n’iwu ime n’ubọchi-izu-ike?

3 Jisus we za ha, si, Ùnu agughi ọbuná ihe a, nke Devid mere, mb͕e agu guru ya, ya onwe-ya na ndi soro ya;

4 otú ọ batara n’ulo Chineke, were kwa ob͕e achicha anēche n’iru Chineke rie ya, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ; nke nēzighi ezi n’iwu ka ha rie, ma nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi?

5 O we si ha, Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.

6 O we rue n’ubọchi-izu-ike di iche, na Ọ batara n’ulo-nzukọ-ha, we nēzí ihe: otù nwoke nọ kwa n’ebe ahu, aka-nri-ya kpọnwu-kwa-ra akpọnwu.

7 Ma ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n’ubọchi-izu-ike; ka ha we hu ihe ha gēji bo Ya ebubo.

8 Ma Ya onwe-ya matara ihe ha nātule n’obi; O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, guzo n’etiti. O we bilie, guzo kwa.

9 Jisus we si ha, Anamaju unu, Ò ziri ezi n’iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n’ubọchi-izu-ike? ìzọ̀puta ndu, ma-ọbu ila ya n’iyì?

10 Mb͕e Ọ lesiri ha nile anya gburugburu, O we si ya, Setipu aka-gi. O we me ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di na mbu.

11 Ma ndi ahu juputara n’enweghi-uche; ha we nēkwurita n’etiti onwe-ha ihe ha gēme Jisus.

12 O rue n’ubọchi ndia, na Ọ puru rigo n’ugwu ahu ikpe ekpere; O we nọgide n’ogologo abali ahu nile n’ikpe ekpere nye Chineke.

13 Mb͕e chi bọrọ, Ọ kpọ ndi nēso uzọ-Ya biakute Ya: O we rọputa nime ha madu iri na abua, ndi Ọ kpọ-kwa-ra aha-ha ndi-ozi;

14 Saimon, onye Ọ kpọ-kwa-ra aha-ya Pita, na Andru nwa-nne-ya, na Jemes na Jọn, na Filip na Batọlọmiu,

15 na Matiu na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Saimon onye anākpọ Zilotis,

16 na Judas nwa Jemes, na Judas Iskariot, onye ghọrọ onye rara ya nye;

17 O we so ha rida, guzo n’ebe di lari, Ya na oké ìgwè ndi nēso uzọ-Ya, na oké ọtutu ndi- Ju ndi si na Judia nile na Jerusalem, na usọ oké osimiri nke Taia na Saidon, puta, ndi biara inu okwu-Ya, na ka ewe me ka aru-ha di ike n’ọria-ha nile;

18 eme-kwa-ra ka aru-ha di ike, bú ndi mọ nādighi ọcha nēsob͕u.

19 Ìgwè madu ahu nile we chọ imetu Ya aka: n’ihi na ike nēsi n’aru-Ya puta, nēme kwa ka aru di ha nile ike.

20 Ya onwe-ya we welie anya-Ya elu le ndi nēso uzọ-Ya, si, Ngọzi nādiri unu, bú ndi-ob͕eye: n’ihi na ala-eze Chineke bu nke unu.

21 Ngọzi nādiri unu ndi agu nāgu ub͕u a: n’ihi na afọ gēju unu. Ngọzi nādiri unu ndi nākwa ákwá ub͕u a: n’ihi na unu gāchì ọchì.

22 Ngọzi nādiri unu, mb͕e ọ bula madu gākpọ unu asì, mb͕e ọ bula ha gēkewapu kwa unu, ta kwa unu uta, tufu kwa aha-unu dika ajọ ihe, n’ihi Nwa nke madu.

23 Ṅurianu ọṅu n’ubọchi ahu, wuli-kwa-nu elu n’ihi ọṅù: n’ihi na le, ugwọ-ọ́lu-unu di uku n’elu-igwe: n’ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma.

24 Ma ahuhu gādiri unu ndi-ọgaranya: n’ihi na unu nēnwezu nkasi-obi-unu.

25 Ahuhu gādiri unu, ndi afọ juworo ub͕u a: n’ihi na agu gāgu unu. Ahuhu gādiri unu, ndi nāchì ọchì ub͕u a: n’ihi na unu gēru újú kwa kwa ákwá.

26 Ahuhu gādiri unu, mb͕e ọ bula madu nile gēkwu okwu ọma bayere unu: n’ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma ugha.

27 Ma asim unu ndi nānu okwum, Nāhunu ndi-iro-unu n’anya, nēmenu ihe ọma nye ndi nākpọ uṅu asì,

28 nāgọzinu ndi nābu unu ọnu, nēkpe ekpere nye ndi nākpali unu.

29 Onye ọ bula nke nēti gi aka n’otù ǹti, che-kwa-ra ya nke-ọzọ; onye nānapu kwa oké uwe-gi, eb͕ochila ya inara kwa uwe-ime-gi.

30 Nēnye onye ọ bula nāriọ gi; onye nānapu gi ihe-gi, ariọkwala ha n’aka-ya ọzọ.

31 Dika unu nāchọ kwa ka madu mere unu, unu onwe-unu nēme kwa ha otú ahu.

32 Ọ buru kwa na unu ahú ndi ahu n’anya, bú ndi nāhu unu n’anya, àha ekele gini diri unu? n’ihi na ọbuná ndi-nmehie nāhu ndi ahu n’anya, bú ndi nāhu ha n’anya.

33 Ọ buru kwa na unu eme ezi ihe nye ndi nēme ezi ihe nye unu, àha ekele gini diri unu? n’ihi na ọbuná ndi-nmehie nēme otù ihe ahu.

34 Ọ buru kwa na unu ewere ihe binye ha, bú ndi unu nēle anya na unu gānata n’aka-ha, àha ekele gini diri unu? ọbuná ndi-nmehie nēwere ihe binye ndi-nmehie, ka ha we nara kwa nke ra ka ya.

35 Ma nāhunu ndi-iro-unu n’anya, nēme-kwa-nu ezi ihe nye ha, nēbinye kwa ihe, ghara iwepu itukwasi-obi; ugwọ-ọlu-unu gādi kwa uku, unu gābu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu: n’ihi na Ya onwe-ya nwere iru-ọma n’ebe ndi nēnweghi ekele na ndi bu ajọ madu nọ.

36 Nwenu obi-ebere, dika Nna-unu nwere obi-ebere.

37 Ọzọ, unu ekpela ikpé, agaghi-ekpe kwa unu ikpé ma-ọli: unu amakwala ikpé, agaghi-ama kwa unu ikpé ma-ọli: rapunu, agārapu kwa unu:

38 nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa ókè, ka ha gēnye n’obi-unu. N’ihi na ihe unu ji tù ihe ka agēji tùkwara unu ọzọ.

39 O we tukwara ha ilu, si, Ònye-ìsì puru idu onye-ìsì? hà abua agaghi-adabà n’olùlù?

40 Onye nēso uzọ onye-ozizí adighi-aka onye-ozizí-ya: ma onye ọ bula mb͕e emere ya ka o zue okè gādi ka onye-ozizí-ya.

41 Ma gini mere i ji le irighiri ahihia nke di n’anya nwa-nna-gi, ma i tugharighi uche na ntuhie nke di n’anya nke gi?

42 Ma-ọbu ì si aṅa pu isi nwa-nna-gi, Nwa-nnam, kwe ka m’tupu irighiri ahihia ahu nke di n’anya-gi, mb͕e gi onwe-gi nāhughi ntuhie nke di n’anya nke gi? Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n’anya nke gi, mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu nke di n’anya nwa-nna-gi.

43 N’ihi na ọ dighi osisi ọma ọ bula nke nāmi nkpuru nābaghi n’ihe; ọzọ kwa, ọ dighi osisi ọ bula nābaghi n’ihe nke nāmi nkpuru ọma.

44 N’ihi na amara osisi ọ bula site na nkpuru nke aka ya. N’ihi na madu adighi-ekpokọta mkpuru fig site n’ogwu, ha adighi-aghọta kwa nkpuru-vine site n’obi-ogwu.

45 Ezi madu site n’ezi àkù nke obi-ya nēweputa ezi ihe; ajọ madu site kwa n’ajọ àkù nke obi-ya nēweputa ajọ ihe: n’ihi na ọnu-ya nēkwu okwu site n’ihe nke obi nwebigara ókè.

46 Ma gini mere unu nākpọm, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, ma unu emeghi ihe nile M’kwuru?

47 Onye ọ bula nke nābiakutem, nke nānu kwa okwum nile, nke nēme kwa ha, M’gēgosi unu onye o yiri:

48 o yiri madu nke nēwu ulo, onye gwuru gwumi kwa, we tọ ntọ-ala n’elu oké nkume: mb͕e miri juru, osimiri we tikwasi ulo ahu, ma o nweghi ike ime ya ka ọ me nkpatu: n’ihi na ewuru ya nke-ọma.

49 Ma onye nānu, ma o meghi ha, yiri madu nke nēwu ulo n’elu ala nēnweghi ntọ-ala; nke osimiri tikwasiri, ngwa ngwa o we dakasi; nbibi nke ulo ahu di kwa uku.

Categories
LUK

LUK 7

1 Mb͕e O kwubìri okwu-Ya nile na nti ndi-Ju, O we ba na Kapanaum.

2 Ma aru adighi orù otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise mma, onye di ya oké ọnu-ahia, ọ nọ n’ọnu ọnwu.

3 Mb͕e ọ nuru ihe bayere Jisus, o we zigara Ya ndi-okenye nke ndi-Ju, nārio Ya ka Ọ bia zọputa orù-ya.

4 Ma mb͕e ha biakutere Jisus, ha riọsie Ya ike, si, Ọ bu onye kwesiri ka I mere ya ihe a:

5 n’ihi na ọ nāhu mba-ayi n’anya, ya onwe-ya wukwara ulo-nzukọ-ayi nye ayi.

6 Jisus we so ha ga. Ma mb͕e Ọ nādighi n’ebe di anya n’ulo-ya ub͕u a, ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise we zigara Ya ufọdu ndi-enyì-ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, esob͕ula Onwe-gi: n’ihi na erughm ka I ba n’okpuru ulom:

7 n’ihi nka agughm onwem onye kwesiri ibiakute Gi: kama were okwu-ọnu kwue, agēme kwa ka aru onye nējerem ozi di ike.

8 N’ihi na mu onwem bu kwa onye edoro n’okpuru ike, nēnwe ndi-agha n’okpuru mu onwem: m’we si onye a, Ga, ọ ga; m’si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m’si kwa orùm, Me nka, o me ya.

9 Ma mb͕e Jisus nuru ihe ndia, o juru Ya anya n’ihi ya, o we chigharia, si ìgwè madu nke nēso Ya, Asim unu, ọ dighi mb͕e M’huru oké okwukwe di otú a, ọbuná n’Israel.

10 Ndi ezitere we laghachi n’ulo-ya, hu ka aru di orù ahu nma.

11 O rue, mb͕e nwa oge gasiri, na Ọ garuru obodo anākpọ Nain; ndi nēso uzọ-Ya we so Ya ga, ha na oké ìgwè madu.

12 Ma mb͕e Ọ biaruru nso ọnu-uzọ-ama obodo ahu, le, anēbupu otù onye nwuru anwu, bú nwa-nwoke nke nne-ya muru nání ya, nwanyi ahu bu kwa onye di-ya nwuru: oké ìgwè nke ndi obodo ahu soro kwa ya.

13 Mb͕e Onye-nwe-ayi huru ya, O we nwe ọmiko n’aru ya, si ya, Akwala ákwá.

14 O we biaru nso, metu ib͕e ozu ahu aka: ndi nēbu ya we guzo. O we si, Nwa-okorọbia, gi ka M’nāsi, Bilie.

15 Onye ahu nke nwuru anwu we nọlie, malite ikwu okwu. O we were ya nye nne-ya.

16 Madu nile we tua egwu: ha we nye Chineke otuto, si, Onye-amuma uku ebiliwo n’etiti ayi: ha si kwa, Chineke eletawo ndi-Ya.

17 Okwu a bayere Ya we pua gazue na Judia dum, na ala nile di ya gburugburu.

18 Ndi nēso uzọ Jọn we kọrọ ya akukọ bayere ihe ndia nile.

19 Jọn we kpọ madu abua biakute ya nime ndi nēso uzọ-ya, zigara Onye-nwe-ayi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ?

20 Ma mb͕e ndikom ahu biakutere Ya, ha si, Jọn Baptist ezìwo ayi biakute Gi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ?

21 N’oge hour ahu O mere ka aru ọtutu madu di ike site n’ọria na ajọ ọria di iche iche na ndi ajọ mọ; O were kwa amara me ka ọtutu ndi-ìsì hu uzọ.

22 O we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu huru na nke unu nuru; ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi- ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n’ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma.

23 Ngọzi nādikwara onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n’ọnyà n’arum.

24 Ma mb͕e ndi-ozi Jọn lasiri, Ọ malitere igwa ìgwè madu nile okwu bayere Jọn, si, Ọ̀ bu gini ka unu puru je n’ọhia ka unu kiri? àmì nke nēme nkpatu site n’ifufe?

25 Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? nwòke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi ezi uwe kachasi mma, ndi bi kwa n’oké oriri na oké ọṅuṅu, nọ n’ulo ndi-eze.

26 Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ònye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku.

27 Nwoke a bu onye edeworo ihe n’akwukwọ nsọ bayere ya, si,

Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n’iru Gi,

Onye gēmezi uzọ-Gi n’iru Gi.

28 Asim unu, N’etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye ka Jọn uku: ma onye dikariri ntà n’ala-eze Chineke ka ya uku.

29 Mb͕e ndi-Ju nile nuru Ya, ha na ndi-ọna-utu, ha we gua Chineke n’onye ezi omume, ebe ejiri baptism nke Jọn me ha baptism.

30 Ma ndi-Farisi na ndi-iwu juru n’onwe-ha ìzù Chineke, ebe ọ nēmeghi ha baptism.

31 Gini kwa ka M’gēji madu nke ọbọ a tuyere, gini kwa ka ha yiri?

32 Ha yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n’ọma-ahia, nākpọ kwa ibe-ha òkù; ndi nāsi, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi mkpu ákwá.

33 N’ihi na Jọn Baptist abiawo nērighi achicha nāṅughi kwa manya-vine; unu we si, O nwere mọ ọjọ.

34 Nwa nke madu abiawo nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu; unu we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, enyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie!

35 Agukwara amam-ihe n’onye ezi omume site n’umu-ya nile.

36 Otù onye n’etiti ndi-Farisi we kpere Ya ka O so ya rie ihe. O we ba n’ulo onye-Farisi ahu, we nọdu na nri.

37 Ma le, otù nwanyi nke nọ n’obodo ahu, bú onye-nmehie; mb͕e ọ mara nke-ọma na Ọ nọduru na nri n’ulo onye-Farisi ahu, o we weta ite alabaster nke manu-otite di ya nime,

38 we guzo n’azu n’ukwu-Ya, nākwa ákwá, we malite iwere anya-miri-ya desa ukwu-Ya abua, o were kwa agiri-isi-ya hicha ha, o we sutu ukwu-Ya ọnu nke-uku, were manu-otite ahu te ha.

39 Ma mb͕e onye-Farisi nke kpọrọ Ya huru ya, o kwue n’onwe-ya, si, Nwoke a, asi na Ọ bu onye amuma, Ọ gāmara onye nwanyi a bu nke nēmetu Ya aka, na aha madu ọ bu, na ọ bu onye-nmehie.

40 Jisus we za, si Ya, Saimon, enwerem okwu M’gāgwa gi. O we si, Onye-ozizí, kwue.

41 Otù onye nke nēbinye madu ihe nwere madu abua ji ya ugwọ: otù onye ji ya nnù shilling na ọgu ise, ibe-ya ji kwa ya ọgu abua na iri.

42 Ebe ha nēnweghi ihe ha gēji kwughachi ya ugwọ, ọ were amara b͕aghara ha abua. Ònye kwa n’etiti ha abua gāhu kari ya n’anya?

43 Saimon we za, si, Ọ dim ka onye o were amara b͕aghara kari. O we si ya, I kpeziri.

44 Mb͕e O chigharisiri n’ebe nwanyi ahu nọ, Ọ si Saimon, Ì huru nwanyi a? Abataram n’ulo-gi, i nyeghi m miri iji sa ukwu: ma nwanyi a were anya-miri-ya desa ukwum, were kwa agiri-isi-ya hicha ha.

45 I sutughm ọnu: ma nwanyi a, site na mb͕e M’batara, ọ rapughi isutu ukwum ọnu nke-uku.

46 I weghi manu tem n’isi: ma nwanyi a were manu-otite tem n’ukwu.

47 N’ihi nka asim i, Ab͕agharaworo ya nmehie-ya, nke di ọtutu; n’ihi na ọ hurum n’anya nke-uku: ma onye ab͕aghara ihe ntà, onye ahu nāhu n’anya nke-ntà.

48 O we si nwayi ahu, Ab͕agharaworo gi nmehie nile gi.

49 Ndi ha na Ya nọduru na nri we malite isirita onwe-ha, Ònye bu Onye a, Nke nāb͕aghara kwa nmehie?

50 O we si nwanyi ahu, Okwukwe-gi azọputawo gi; la n’udo.

Categories
LUK

LUK 8

1 O we rue mb͕e nwa oge gasiri, na Ya onwe-ya nāgaghari n’obodo na obodo ntà di iche iche, nēkwusa nēzikwa ozi ọma ala-eze Chineke, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu,

2 na ndinyom ufọdu ndi emereri ka aru-ha di ike site n’ichupu ndi-mọ ọjọ na igwọ nriaria, Meri nke akpọrọ Magdalini, onye mọ ọjọ asa siwori nime ya puta,

3 na Joana nwunye Kuza onye Herod tiyere ihe-ya n’aka, na Susana, na ọtutu ndi ọzọ, ndi nēweputa ihe ha nwere ime ezi ha.

4 Ma mb͕e oké ìgwè madu nēzukọ, mb͕e ndi si n’obodo nile nābiakute kwa Ya, O we kwue okwu site n’ilu:

5 Ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru-ya: mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n’akuku uzọ; ewe zọkwasi ha ukwu, anu-ufe nke elu-igwe we tuturie ha.

6 Nkpuru ọzọ we da n’elu oké nkume; mb͕e ha puru ome, ha we kpọnwua, n’ihi na ha enweghi ala miri.

7 Nkpuru ọzọ we da n’etiti ogwu; ogwu ahu we so ha pue, kpab͕ue ha.

8 Nkpuru ọzọ we da n’ezi ala, ha we pue, we mia nkpuru ọgu ise ọgu ise. Mb͕e O nēkwu okwu ndia, O tie nkpu, si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu.

9 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ihe ilu a gābu.

10 O we si, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze Chineke: ma ndi fọduru ka anāgwa okwu n’ilu; ka ha ghara ihu n’ọhuhu, ghara kwa inuta n’ọnunu.

11 Ma ilu ahu bu nka: Nkpuru ahu bu okwu Chineke.

12 Ndi nọ n’akuku uzọ ahu bu ndi nuru; mb͕e ahu ekwensu bia, we napu okwu ahu n’obi-ha, ka ha ghara ikwere, ewe zọputa ha.

13 Ndi nọ kwa n’oké nkume ahu bu ndi were ọṅù nara okwu ahu mb͕e ọ bula ha nuru ya; ma ndia enweghi nkpọrọgwu, ndi kwere na nwa oge, ma n’oge ọnwunwa ha wezuga onwe-ha.

14 Nkpuru nke dara n’etiti ogwu ahu, ndia bu ndi nuru, ma mb͕e ha nāga n’uzọ-ha ncheb͕u na àkù na ihe-utọ nke ndu anākpab͕u ha, ha amighi ezi nkpuru.

15 Nkpuru nke di n’ala ọma ahu, ndia bu ndi were ezi obi di nma jisie okwu ahu ike, mb͕e ha nuru ya, ha were kwa ntachi-obi mia nkpuru.

16 Ma ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nēkpuchi ya n’ihe, ma-ọbu dọba ya n’okpuru ihe-ndina; kama ọ nādọba ya n’elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nke nābà nime we hu ìhè-ya.

17 N’ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-eme ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe di nzuzo, nke anāgaghi-ama, me kwa ka ọ puta ìhè.

18 Ya mere, lezienu anya otú unu si anu: n’ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye; onye ọ bula nēnweghi kwa, ọbuná ihe ọ nēchè na o nwere ka agānapu ya.

19 Ma nne-Ya na umu-nne-Ya biakutere Ya, ma ha apughi ibiaru Ya nso n’ihi ìgwè madu ahu.

20 Ewe si Ya, Nne-gi na umu-nne-gi nēguzo n’èzí, nāchọ ihu Gi anya.

21 Ma Ọ zara, si ha, Nnem na umu-nnem bu ndia ndi nānu okwu Chineke, nēme kwa ya.

22 O rue n’otù nime ubọchi ahu, na Ọ batara n’ub͕ọ, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya; O we si ha, Ka ayi gabiga n’ofè ọdọ-miri a ọzọ: ha we nupu.

23 Ma mb͕e ha nēje Ọ da n’ura: oké ajọ ifufe we da n’ọdọ-miri ahu; miri nēju kwa n’ub͕ọ-ha, ha we nọdu n’ọnu ọnwu.

24 Ha we biakute Ya, kpọte Ya, si, Nna-ayi, Nna-ayi, ayi nāla n’iyì. O we teta, bara ifufe na ebili-miri mba: ha we da juu, ndaju we di.

25 O we si ha, Òle ebe ka okwukwe-unu di? Ha we tua egwu, o ju ha anya, ha sirita onwe-ha, Ònye bu kwa Onye a, na Ọ nēnye ọbuná ifufe na miri iwu, ha nāṅa kwa Ya nti?

26 Ha we rue ala ndi Gerasa, nke di na ncherita-iru Galili.

27 Ma mb͕e O siri n’ub͕ọ puta rigo n’ala, otù nwoke nke si n’obodo ahu puta zutere ya, bú onye nwere ndi-mọ ọjọ; ma na mb͕e di anya ọ dighi uwe o yiri, o bighi kwa n’ulo, kama n’ebe anēlì ozu.

28 Ma mb͕e ọ huru Jisus, o tisie nkpu ike, da kwa n’ala n’iru Ya, were oké olu si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? ariọm Gi, emekpalam aru.

29 N’ihi na O nyere mọ ahu nādighi ọcha iwu ka o si nime nwoke ahu puta. N’ihi na ọtutu mb͕e ka ọ nējisi ya ike: anēche kwa ya nche, ewere kwa nkpọrọ na nkpọrọ-ukwu ke ya; o we nyajipu ihe eji ke ya, mọ ọjọ ahu we churu ya ba n’ọhia.

30 Jisus we jua ya, si, Òle aha-gi? Ọ si, Legion; n’ihi na ọtutu ndi-mọ ọjọ bàra nime ya.

31 Ha we riọ Ya ka ọ ghara inye ha iwu ka ha je ba n’abyss.

32 Ma ìgwè ọtutu ezì di n’ebe ahu nāta nri n’ugwu: ha we riọ Ya ka O kwere ha ka ha ba nime ha. O we kwere ha.

33 Ndi-mọ ọjọ ahu we si nime nwoke ahu puta, ba nime ìgwè ezì ahu: ìgwè ezi ahu we nuda n’ebe ahu di nkputankpu dabà n’ọdọ-miri, miri we b͕ab͕ue ha.

34 Ma mb͕e ndi nāzù ha huru ihe emereri, ha b͕alaga, kọsa ya n’obodo ahu na gburugburu ya nile.

35 Ha we pua ihu ihe emereri; ha we biakute Jisus, we hu nwoke ahu, nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta, ka ọ nọduru ala n’ukwu Jisus, yiri uwe, uche-ya zu-kwa-ra okè: ha we tua egwu.

36 Ndi huru ya we kọrọ ha otú azọputara onye ahu ndi-mọ ọjọ ji.

37 Ọra nile nke ala ndi Gerasa di ya gburugburu we kpere Ya ka O si n’ebe ha nọ la; n’ihi na ha nātu oké egwu: O we ba nime ub͕ọ, laghachi.

38 Ma nwoke nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta nāriọ Ya ka ya na Ya biri: ma O zilagara ya, si,

39 Laghachi n’ulo-gi, kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke meworo gi. O we je, nēkwusa n’obodo ahu dum ihe Jisus mere ya, ka ha ra.

40 Ma mb͕e Jisus laghachiri, ìgwè madu ahu nara Ya nke-ọma; n’ihi na ha nile nēle anya Ya.

41 Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Jeairọs, biara, ya onwe-ya bu kwa onye-isi ulo-nzukọ: o we da n’ala n’ukwu Jisus, we riọ Ya ka Ọ bia n’ulo-ya;

42 n’ihi na o nwere nwa-nwanyi ọ muru nání ya, nke b͕ara ihe ra ka arọ iri na abua, nwata ahu nānwu kwa anwu. Ma mb͕e Ọ nēje ìgwè madu nile nākpab͕u Ya.

43 Otù nwanyi nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, nke mefusiri ihe dum o ji biri n’aru ndi-dibia, ma ọ dighi onye ọ bula nwere ike ime ka aru-ya di ike,

44 nwanyi ahu we bia n’azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ngwa ngwa orùrù-ọbara-ya we guzo.

45 Jisus we si, Ònye bu onye ahu nke meturum aka? Ma mb͕e madu nile di nāgo, Pita na ndi ya na ha yikọ si, Nna-ayi, ìgwè madu ndia nādagide Gi nākpab͕u kwa Gi.

46 Ma Jisus siri, Madu meturum aka: n’ihi na Mu onwem mara na ike esiwori n’arum puta.

47 Ma mb͕e nwanyi ahu huru na o zoghi ezo, o were ima-aru-jijiji bia, we da n’iru Ya, kọ n’iru ndi-Ju ahu nile ihe mere o ji metu Ya aka, na otú esi me ka aru di ya ike ngwa ngwa.

48 Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n’udo.

49 Mb͕e Ọ kpu okwu n’ọnu, otù onye si n’ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwayi anwuruwo; esob͕u-kwa-la Onye-ozizí a ọzọ.

50 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ za ya, si, Atula egwu: kwere nání, agāzọputa kwa ya.

51 Ma mb͕e Ọ biaruru ulo ahu, O kweghi onye ọ bula so Ya ba, ma-ọbughi Pita, na Jọn, na Jemes, na nna nwata-nwayi ahu na nne-ya.

52 Ma madu nile nākwa ákwá, nēti kwa aka n’obi n’ihi ya: ma Ọ siri, Unu akwala ákwá; n’ihi na ọ nwughi anwu, kama ọ nāraru ura.

53 Ha we chìa Ya ọchì, ebe ha matara na ọ nwuru anwu.

54 Ma Ya onwe-ya jidere ya n’aka, we kpọ, si, Nwata-nwanyi, bilie.

55 Mọ-ya we lata, o wè bilie ngwa ngwa: O we si ka enye ya ihe-oriri.

56 Ibobo we nwubiga ndi muru ya ókè n’aru: ma O nyere ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe emereri.

Categories
LUK

LUK 9

1 O we kpọkọta ndi-ozi iri na abua ahu, nye ha ike na ichi-isi n’ebe ndi-mọ ọjọ nile nọ, na igwọ ọria di iche iche.

2 O we zipu ha ikwusa ala-eze Chineke, na ime ka aru di ndi-nriaria ike.

3 O we si ha, Unu ewela ihe ọ bula n’ije-unu, unu ewela nkpa-n’aka, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ob͕e achicha, ma-ọbu ego; unu enwe-kwa-la uwe-ime abua.

4 Ulo ọ bula unu gābà, nọgidenu n’ebe ahu, si kwa n’ebe ahu pua.

5 Ka ha ra kwa, bú ndi nānaraghi unu nke-ọma, mb͕e unu nāpu n’obodo ahu tichapu ájá di n’ukwu-unu ka ọ buru ha àmà.

6 Ha we pua, we nējezu obodo ntà ahu nile, nēzisa ozi ọma Ya, nēme kwa ka aru madu di ike n’ebe nile.

7 Ma Herod, bú tetrarch, nuru ihe nile emere: o we nēcheb͕u onwe-ya, n’ihi na ufọdu siri, na Jọn esiwori na ndi nwuru anwu bilie;

8 ufọdu si-kwa-ra, na Elaija aputawori ihè; ndi ọzọ si-kwa-ra na otù onye nime ndi-amuma ochie esiwori n’ọnwu bilie ọzọ.

9 Ma Herod siri, Mu onwem bipuru isi Jọn: ma ònye bu Onye a, Nke m’nānu ihe bayere Ya di otú a? O we nāchọ uzọ ihu Ya anya.

10 Mb͕e ndi-ozi Jisus latara, ha we kọrọ Ya ihe nile ha mere, ka ha ra. O we chiri ha tiyere Onwe-ya, wezuga Onwe-ya iche rue obodo anākpọ Betsaida.

11 Ma mb͕e ìgwè madu nile mara ya, ha soro Ya: O we nara ha nke-ọma, we gwa ha okwu bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi ọ di nkpà ka eme ka aru-ha di ike.

12 Ma chi malitere iji; ndi-ozi iri na abua ahu we biakute Ya, si Ya, Zilaga ìgwè madu a, ka ha we ga n’obodo ntà nile na ubi nile di buruburu, nọ ọnọdu-abali, chọta kwa ihe ha gēri; n’ihi na ayi nọ n’ebe a nime ọhia.

13 Ma Ọ siri ha, Unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si, Ayi enweghi kari ob͕e achicha ise na azù abua; ma-ọbughi na ayi onwe-ayi gāga zuta nri nye ndi nka nile.

14 N’ihi na ha ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri. O we si ndi nēso uzọ-Ya, Menu ka ha nọdu ala n’òtù di iche iche, ihe dika ọgu madu abua na iri n’otù òtù.

15 Ha we me otú ahu, me ka ha nile nọdu ala.

16 O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n’elu-igwe, gọzie ha, nyawa; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n’iru ìgwè madu ahu.

17 Ha we rie, afọ ju-kwa-ra ha nile: ewe tutukọ iberibe fọduru ha, nkata iri na abua.

18 O rue, mb͕e nání Ya nọ nēkpe ekpere, ndi nēso uzọ-Ya nọyere Ya: O we jua ha, si, Ònye ka ọra madu nāsi na Mu onwem bu?

19 Ha we za, si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ndi ọzọ si, na otù onye nime ndi-amuma ochie esiwo n’ọnwu bilie ọzọ.

20 O we si ha, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si, Kraist nke Chineke.

21 Ma Ọ dọrọ ha aka na nti, nye kwa ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe a;

22 si, Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, aghaghi ib͕u kwa Ya, na ime kwa ka O si n’ọnwu bilie n’ubọchi nke-atọ.

23 O we si ha nile, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n’azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya kwa-ubọchi, nēsokwam.

24 N’ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọpuita ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n’ihim, onye ahu gāzọputa ya.

25 N’ihi na ùrù gini ka ọ nābara madu, ma ọ buru na o rita uwa dum n’urù, o we tufue ma-ọbu anapu ya onwe-ya?

26 N’ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme, ihere onye ahu gēme Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n’ebube nke aka Ya, na ebube nke Nna-Ya, na ebube nke ndi-mọ-ozi-Ya di nsọ.

27 Ma asim unu n’ezie, Ufọdu di n’etiti ndi guzoro n’ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli, rue mb͕e ha gāhu ala-eze Chineke.

28 O we rue mb͕e ubọchi asatọ gasiri mb͕e O kwusiri okwu ndia, na Ọ chiri Pita na Jọn na Jemes tiyere Onwe-ya, rigo n’ugwu ahu ikpe ekpere.

29 Mb͕e Ọ nēkpe ekpere, oyiyi iru-Ya we di iche, uwe-Ya we nācha ucha nēb͕u kwa dika àmùma.

30 Ma le, Ya na ndikom abua nēkwurita okwu, ndi bu Moses na Elaija;

31 ndi emere ka ahu ha anya n’ebube, ndi nēkwu kwa okwu bayere ọlila-Ya, nke Ọ gaje imezu na Jerusalem.

32 Ma ura jururi Pita na ndi ya na ha nọ n’anya: ma mb͕e ha tetara nke-ọma, ha hu ebube-Ya, na ndikom abua ahu Ya na ha guzoro.

33 O we rue, mb͕e ha si n’ebe Ọ nọ nēkewapu, Pita si Jisus, Nna-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n’ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Eliaja: n’ihi na ọ mataghi ihe ọ nēkwu.

34 Mb͕e ọ nēkwu okwu ndia, igwe-oji we bia, kpuchie ha: ha we tua egwu mb͕e ha nābà n’igwe-oji ahu.

35 Olu we si n’igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam, Onye M’rọputara: nurunu okwu-Ya.

36 Mb͕e olu ahu putasiri, ahuru nání Jisus. Ndi ahu we kpuchie ọnu-ha, ha akọghi kwa akukọ ihe ọ bula ha hururi nye onye ọ bula na mb͕e ahu.

37 O rue, n’ubọchi so ya, mb͕e ha siri n’ugwu ahu rida, na oké ìgwè madu zutere Ya.

38 Ma le, otù nwoke si n’ìgwè madu ahu ti nkpu, si, Onye-ozizí, ariọm Gi ka I le nwam nwoke anya; n’ihi na ọ bu nwam m’muru nání ya:

39 le kwa, ajọ mọ nējide ya, o we nēti nkpu na mberede; ajọ mọ ahu nēse kwa ya, me ka ọ nāsu ufufu n’ọnu, o ji kwa ike arapu ya, nēchihia ya aru nke-uku.

40 M’we riọ ndi nēso uzọ-Gi ka ha chupu ya; ma ha apughi.

41 Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ, ewem nagide kwa unu? kuta nwa-gi n’ebe a.

42 Mb͕e ọ nọ nābiakute Ya, mọ ọjọ ahu we tuda ya n’ala, sesie ya ike. Ma Jisus bara mọ ahu nādighi ọcha nba, we me ka aru nwa-okoro ahu di ike, O we kuru ya nyeghachi nna-ya.

43 Ma ibobo idi-uku nke Chineke nwuru ha nile n’aru.

Ma mb͕e ihe nile Ọ nēme nēju madu nile anya, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,

44 Unu onwe-unu debe okwu ndia na nti-unu: n’ihi na agaje irara Nwa nke madu nye n’aka madu.

45 Ma ha aghọtaghi okwu a, ọ bu kwa ihe ezonariwori ha, ka ha ghara inuta ya: ha nātu kwa egwu iju Ya ajuju bayere okwu a.

46 Iru-uka we da n’etiti ha, onye gāka ibe-ya uku n’etiti ha.

47 Ma mb͕e Jisus huru iru-uka nke di n’obi-ha, O jide nwatakiri n’aka, debe ya n’akuku Ya,

48 we si ha, Onye ọ bula nke gānara nwatakiri a nke-ọma n’aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma nānara Onye ziputaram nke-ọma: n’ihi na onye dikari ntà n’etiti unu nile, onye ahu bu onye uku.

49 Jọn we za, si, Nna-ayi, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n’aha-Gi; ayi we b͕ochie ya, n’ihi na ọ dighi-eso ayi.

50 Ma Jisus siri ya, Unu eb͕ochila ya: n’ihi na onye nādighi-emegide unu diri unu.

51 O rue, mb͕e ubọchi nēzu okè mb͕e agānara Ya n’elu, na Ya onwe-ya che iru-Ya si-ike iga Jerusalem,

52 O we zipu ndi-ozi n’iru Ya: ha we ga, ba n’otù obodo ntà nke ndi Sameria, ka ha doziere Ya.

53 Ma ha anaraghi Ya nke-ọma, n’ihi na iru-Ya di ka Ọ nāga Jerusalem.

54 Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya, bú Jemes na Jọn, huru nka, ha si, Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n’elu-igwe da, rechapu ha?

55 O we chigharia, bara ha nba, si, Unu amataghi aha mọ di nime unu.

56 N’ihi na Nwa nke madu abiaghi ila ndu madu n’iyì, kama ka o we zọputa ha. Ha we pua ga n’obodo ntà ọzọ.

57 Mb͕e ha nāga n’uzọ, otù onye we si Ya, M’gēso Gi ebe ọ bula Ì nēje.

58 Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.

59 O we si onye ọzọ, Som. Ma ọ siri, Onye-nwe-ayi, kwe ka m’buru uzọ je lìe nnam.

60 Ma Ọ siri ya, Rapu ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu; ma gi onwe-gi je zisa ozi ala-eze Chineke.

61 Onye ọzọ we si kwa, M’gēso Gi, Onye-nwe-ayi; ma kwe ka m’buru uzọ kele ndi nọ n’ulom ekele ikpe-azu.

62 Ma Jisus siri ya, Ọ dighi onye ọ bula nke nēle anya n’azu, mb͕e o tiyesiri aka-ya n’ọ́gù anu-ulo nādọkpughari, kwesiri ala-eze Chineke.

Categories
LUK

LUK 10

1 Ma mb͕e ihe ndia gasiri Onye-nwe-ayi guputara ọgu ndikom atọ na iri di iche, we zipu ha abua abua ka ha ga n’iru Ya ba n’obodo na ebe ọ bula, ebe Ya onwe-ya gaje ibia.

2 O we si ha, Owuwe-ihe-ubi riri nne n’ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole: ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu ba n’owuwe-ihe-ubi-Ya.

3 Jenu: le, Mu onwem nēzipu unu dika umu-aturu n’etiti agu.

4 Unu ewela àkpà-ego, ma-ọbu àkpà-ije, ma-ọbu akpukpọ-ukwu: unu ekele-kwa-la onye ọ bula n’uzọ.

5 Ma ulo ọ bula unu gābà nime ya, burunu uzọ si, Udo diri ulo a.

6 Ọ buru kwa na onye-udo nọ n’ebe ahu, udo-unu gānọkwasi ya: ma ọ buru na onye-udo anọghi ya, udo-unu gālaghachiri unu ọzọ.

7 Nọgide-kwa-nu n’ulo ahu, nēri nāṅu kwa ihe ha nēnye umu: n’ihi na onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya. Unu esila n’otù ulo ba n’ulo ọzọ.

8 Nime obodo ọ bula unu gābà kwa, ha we nara unu nke-ọma, rienu ihe edebere n’iru unu:

9 mekwanu ndi aru-ha nādighi ike nọ n’ebe ahu ka aru-ha di ike, si-kwa-nu ha, Ala-eze Chineke di unu nso.

10 Ma nime obodo ọ bula unu gābà, ma ha anaraghi unu nke-ọma, puanu n’amá-ya, si,

11 Ọbuná ájá si n’obodo-unu, nke rakuru n’ukwu-ayi, ka ayi nēhichapu imegide unu: otú ọ di, maranu nka, na ala-eze Chineke di nso.

12 Asim unu, Ala Sọdọm gānagide okwu n’ubọchi ahu kari obodo ahu.

13 Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n’ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon, nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n’oge di anya gara aga, nānọdu n’ákwà-nkpe na ntu.

14 Otú ọ di, Taia na Saidon gānagide okwu n’ikpé ahu kari unu.

15 Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? agēweda gi rue Hedis.

16 Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem.

17 Ọgu ndikom atọ na iri ahu were ọṅù lata, si, Onye-nwe-ayi, ọbuná ndi-mọ ọjọ ka anēdo n’okpuru ayi n’aha-Gi.

18 O we si ha, Ahurum Setan ka ọ darari dika àmùmà pua n’elu-igwe.

19 Le, enyewom unu ike izọkwasi agwọ na akpi ukwu, na imegide ike onye-iro-unu nile: ọ dighi kwa ihe ọ bula gēmeru unu aru ma-ọli.

20 Otú ọ di, unu aṅurila ọṅu na nka, na anēdo ndi ajọ mọ n’okpuru unu; ma ṅurianu ọṅu na edewo aha-unu n’akwukwọ n’elu-igwe.

21 N’oge hour ahu tọrọ Ya utọ nke-uku nime Mọ Nsọ, O we si, Ekelem Gi, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: e, Nna; ekelem Gi na ọ di ezi nma otú a n’iru Gi.

22 Nnam rara ihe nile nyem n’aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mara Onye Ọkpara ahu bu, ma-ọbughi Nna-Ya; na Onye Nna ahu bu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.

23 Mb͕e O chigharisiri n’ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, O we si n’iche, Ngọzi nādiri anya nāhu ihe unu nāhu:

24 n’ihi na asim unu, na ọtutu ndi-amuma na ndi-eze chọrọ ihu ihe unu onwe-unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha.

25 Ma le, otù onye-iwu biliri, we nwa Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu gini ka m’gēme ka m’we keta ndu ebighi-ebi?

26 O we si ya, Gini ka edeworo n’akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya?

27 O we za, si, Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n’anya site n’obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum; hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi.

28 O we si ya, I zara nke-ọma: me nka, i gādi kwa ndu.

29 Ma ebe ọ nāchọ igu onwe-ya n’onye ezi omume, ọ si Jisus, Ònye bu kwa onye-ab͕ata-obim?

30 Jisus zara ya, si, Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n’etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ.

31 Ma n’otù mb͕e ahu otù onye-nchu-àjà nārida n’uzọ ahu: mb͕e ọ huru ya, o we si n’akuku uzọ ọzọ gabiga.

32 Otú ahu onye Livai, mbe ọ biaruru ebe ahu, hu kwa ya, o we si kwa n’akuku uzọ ọzọ gabiga.

33 Ma otù onye Sameria, mb͕e ọ nọ n’ije, ọ bia rue n’ebe ọ nọ: mb͕e ọ huru ya, o we nwe ọmiko n’aru ya,

34 o we biakute ya, ke ọnyá nile ya, wukwasi ha manu na manya-vine; o we tukwasi ya n’anu-ulo nke aka ya, dubata ya n’ulo ndi-ọbìa, we le ya anya nke-ọma.

35 N’echi-ya o we tuputa shilling abua, nye onye-nwe ulo ndi-ọbìa ahu, si, Le ya anya nke-ọma; ihe ọ bula i n’akuku uzọ kari, mu onwem, mb͕e m’latara, m’gākwughachi gi.

36 Ọ̀ bu onye nime madu atọ a, ka i chère, gosiri onwe-ya ka onye-ab͕ata-obi nke onye ahu dabàra n’etiti ndi ahu nāpunara madu ihe?

37 Ọ si, Onye ahu nke mere ya ebere. Jisus we si ya, Ga, gi onwe-gi me kwa otú ahu.

38 Ma mb͕e ha nāga, Ya onwe-ya batara n’otù obodo ntà: otù nwanyi, aha-ya bu Mata, we kpọbata Ya n’ulo-ya.

39 O nwekwara nwa-nne-nwanyi anākpọ Meri, onye nānọdu kwa ala n’ukwu ala Onye-nwe-ayi, we nu okwu-Ya.

40 Ma uche Mata nābasasi n’ije-ozi nke-uku; o we biakute Ya ọsọsọ, si, Onye-nwe-ayi, ò metughi Gi n’obi na nwa-nnem nwanyi nārapum ka nání mu nēje ozi? ya mere, gwa ya ka o yerem aka.

41 Ma Onye-nwe-ayi zara, si ya, Mata, Mata, i nēcheb͕u onwe-gi nēsob͕u kwa onwe-gi n’ihi ọtutu ihe:

42 ma otu ihe bu ihe di nkpà: n’ihi na Meri rọputara ezi òkè ahu, nke anāgaghi-anapu ya.