Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 21

1 Jehova we si Moses, Gwa ndi-nchu-àjà, bú umu-ndikom Eron, okwu, si ha, Onye-nchu-àjà agaghi-emeru onwe-ya n’ihi madu nwuru anwu n’etiti umu-nna-ya;

2 ma-ọbughi nání n’ihi onye-aru-ya, nke di ya nso, n’ihi nne-ya, na n’ihi nna-ya, na n’ihi nwa-ya nwoke, na n’ihi nwa-ya nwayi, na n’ihi nwa-nne-ya nwoke:

3 na n’ihi nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke, nke di ya nso, nke ọ dighi mb͕e nwoke luru ya na nwunye, n’ihi ya ka ọ gēmeru onwe-ya.

4 Ọ gaghi-emeru onwe-ya, ime onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ, ebe ọ bu onye-nwe madu n’etiti umu-nna-ya.

5 Ha agaghi-eme onwe-ha isi-nkwọcha n’isi-ha, ha agaghi-akọpu kwa usọ afu-ọnu-ha, ha agaghi-eb͕u kwa eb͕ub͕u n’anu-aru-ha.

6 Ndi nsọ ka ha gāburu Chineke-ha, ha agaghi-eme kwa ka aha Chineke-ha ghara idi nsọ: n’ihi na àjà-ọku Jehova, bú nri Chineke-ha, ka ha onwe-ha nēweta nso: ha gādi kwa nsọ.

7 Ha agaghi-aluru nwayi nākwa iko na nwunye, ma-ọbu nwayi nke emeworo ka ọ ghara idi nsọ; ha agaghi-alu kwa nwayi achupuru achupu n’aru di-ya: n’ihi na nsọ ka ọ di n’ebe Chineke-ya nọ.

8 I gēdo kwa ya nsọ; n’ihi na nri Chineke-gi ka ya onwe-ya nēweta nso: nsọ ka ọ gādi n’ebe i nọ: n’ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, di, Nke nēdo gi nsọ.

9 Nwa-nwayi nke onye-nchu-aja ọ bula kwa, mb͕e ọ gēme onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ site n’ikwa iko, nna-ya ka nwanyi ahu nēme ka ọ ghara idi nsọ: n’ọku ka agēsure ya.

10 Ma onye-nchu-àjà n’etiti umu-nna-ya, onye awukwasiworo manu nke otite-manu n’isi-ya, onye emejuwo-kwa-ra aka-ya iyiri uwe ahu, ọ gaghi-atọpu agiri-isi-ya, ọ gaghi-adọwa kwa uwe-ya;

11 ọ gaghi-abakuru kwa madu nwuru anwu, ọ gaghi-emeru kwa onwe-ya n’ihi nna-ya, ma-ọbu n’ihi nne-ya;

12 ọ gaghi-esi kwa n’ebe nsọm pua, ọ gaghi-eme kwa ka ebe nsọ Chineke-ya ghara idi nsọ; n’ihi na nkewapu nke manu nke otite-manu nke Chineke-ya dikwasi ya: Mu onwem bu Jehova.

13 Ya onwe-ya gāluru nwunye mb͕e ọ di na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke.

14 Nwayi-di-ya nwuru, ma-ọbu nke achupuru achupu, ma-ọbu nke emere ka ọ ghara idi nsọ, bú nwayi nākwa iko, ndia ka ọ nāgaghi-aluru na nwunye: ma nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke nke sitere n’umu-nna-ya ka ọ gāluru na nwunye.

15 Ọ gaghi-eme kwa ka nkpuru-ya ghara idi nsọ n’etiti umu-nna-ya: n’ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ya nsọ.

16 Jehova we gwa Moses okwu, si,

17 Gwa Eron okwu, si, Nwoke ọ bula nke nkpuru-gi rue ọb͕ọ-ha nile nke ọlu di n’aru ya, ya abiarula nso iweta nri Chineke-ya nso.

18 N’ihi na nwoke ọ bula nke ọlu di n’aru ya, ọ gaghi-abiaru nso: nwoke nke bu onye-ìsì, ma-ọbu onye-ngwurọ, ma-ọbu nke nwere imi-npia, ma-ọbu nke nwere n’aru-ya ihe ibe-ya nēnweghi,

19 ma-ọbu nwoke nke ukwu kpajiri, akpaji, ma-ọbu aka kpajiri akpaji, di n’aru ya,

20 ma-ọbu onye-nkpunkpu-azu, ma-ọbu onye-ùkpọ̀, ma-ọbu nke nwere ntupọ n’anya-ya, ma-ọbu nke àb͕à nāta, ma-ọbu nke nwere ire-ebube, ma-ọbu nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia;

21 ọ dighi nwoke ọ bula nke nkpuru Eron onye-nchu-àjà, nke ọlu di n’aru ya, gābiaru nso iweta àjà-ọku Jehova nso: ọlu di n’aru ya; ọ gaghi-abiaru nso iweta nri Chineke-ya nso.

22 Nri Chineke-ya, nke sitere n’ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, na n’ihe nsọ nile, ka o gēri.

23 Nání na ọ gaghabà rue ákwà-nb͕ochim, ọ gaghi-abiaru kwa nso ebe-ichu-àjàm, n’ihi na ọlu di n’aru ya; ka ọ we ghara ime ka ebe nsọm nile ghara idi nsọ: n’ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.

24 Moses we gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 22

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa Eron na umu-ya ndikom okwu, ka ha kewapu onwe-ha n’ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ndi ahu nēdorom nsọ, ka ha ghara kwa ime ka aha nsọm ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.

3 Si ha, Nwoke ọ bula nke nkpuru-unu nile rue ọb͕ọ-unu nile, nke nābiaru nso ihe nsọ nile, nke umu Israel nēdoro Jehova nsọ, ma orurú-ya di n’aru ya, agēbipu madu ahu n’irum: Mu onwem bu Jehova.

4 Nwoke ọ bula nke nkpuru Eron nke bu onye-ekpenta, ma-ọbu nke nwere orùrù; ọ gaghi-eri ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, rue mb͕e ọ di ọcha. Ọzọ, onye nēmetu ihe ọ bula ruru árú nke madu nwuru anwu aru, ma-ọbu nwoke nke ure-ya nēsi n’aru-ya pua;

5 ma-ọbu nwoke nke nēmetu ihe ọ bula nēnuputa enuputa aru, nke ruru árú n’ebe ọ nọ ma-ọbu nke nēmetu nwoke nke ruru árú n’ebe ọ nọ aru, ọbuná ọrurú-ya ọ bula;

6 madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi, ọ gagheri kwa ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, ma ọ buru na ọ saghi anu-aru-ya na miri.

7 Ma mb͕e anyanwu daworo, ọ gādi ọcha; emesia ọ gēri ihe ufọdu nime ihe nsọ nile, n’ihi na nri-ya ka ọ bu.

8 Ihe nwuru onwe-ya, ma-ọbu ihe anu-ọhia dọb͕uru, ọ gaghi-eri ya, iwere ya meru onwe-ya: Mu onwem bu Jehova.

9 Ha gēdebe kwa ihe-ndebem, ka ha we ghara ibū nmehie bayere ya, nwua nime ya, mb͕e ha nēme ya ka ọ ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.

10 Ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe nsọ ahu: onye nānọdu n’ulo onye-nchu-àjà, ma-ọbu onye egoro ọlu agaghi-eri ihe nsọ ahu.

11 Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāb͕ata madu, bú onye o ji ego-ya b͕ata, onye ahu gēri ufọdu nime ya; ya na onye amuru n’ulo-ya, ndi ahu gēri ufọdu nime nri-ya.

12 Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e onye ala ọzọ nwere ya na nwunye, nwayi ahu agaghi-eri ihe ọ bula nime àjà-nbuli nke ihe nsọ nile.

13 Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e ọ bu nwanyi di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi achupuru achupu, ma o nweghi nkpuru, o we laghachi n’ulo nna-ya, dika mb͕e ọ di na nwata, ihe nime nri nna-ya ka o gēri: ma ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe ọ bula nime ya.

14 Ma mb͕e onye ọ bula gēri ihe nsọ n’amaghi-ama, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n’uzo ise ya n’elu ya, nye onye-nchu-àjà ihe nsọ ahu.

15 Ha agaghi-eme kwa ka ihe nsọ nke umu Israel ghara idi nsọ, bú nke ha nēbuliri Jehova;

16 ha we ghara ime ka ha nēbu ajọ omume nke ikpe-ọmuma, mb͕e ha nēri ihe nsọ ha: n’ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.

17 Jehova we gwa Moses okwu, si,

18 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu, si ha, Nwoke ọ bula nke sitere n’ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa n’Israel, nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú nke diri nkwa-ha nile, ma-ọbu nke diri onyinye-afọ-ofufo-ha nile, nke ha nēweta nso Jehova ka ọ buru àjà-nsure-ọku;

19 unu gēweta nso oké nke zuru okè n’etiti ìgwè ehi, ma-ọbu n’etiti aturu, ma-ọbu n’etiti ewu, ka unu we buru ihe nātọ utọ.

20 Ihe ọ bula nke ọlu di n’aru ya, unu ewetala ya nso: n’ihi na ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ n’ọnọdu unu.

21 Ọzọ mb͕e onye ọ bula nēweta nso Jehova ihe àjà nke àjà-udo imezu nkwa, ma-ọbu inye onyinye-afọ-ofufo, n’etiti ìgwè ehi ma-ọbu n’etiti ìgwè ewu na aruru, ihe zuru okè ka ọ gābu ibu ihe nātọ utọ: ọlu ọ bula agaghi-adi n’aru ya.

22 Ihe kpuru ìsì, ma-ọbu ihe kpajiri akpaji, ma-ọbu ihe emeruru aru, ma-ọbu ihe nwere ọnyá, ma-ọbu ihe àb͕à nāta, ma-ọbu ihe nwere ire-ebube, unu ewetala ndia nso Jehova, unu esite-kwa-la na ha chuara Jehova àjà-ọku n’elu ebe-ichu-àjà-Ya.

23 Oke-ehi ma-ọbu nwa-aturu nke nwere n’aru-ya ihe ibe-ya nēnweghi, ma-ọbu nke kpọrọ ùkpọ̀, onyinye-afọ-ofufo ka i gēme ya; ma ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ bayere nkwa.

24 Ihe nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia, ma-ọbu nke piara apia, ma-ọbu nke adọwapuru adọwapu, ma-ọbu nke ebipuru ebipu, unu ewetala ya nso Jehova: unu eme-kwa-la otú a n’ala-unu.

25 Unu esite-kwa-la n’aka onye ala ọzọ weta nso nri Chineke-unu site n’ihe ndia nile; n’ihi na nbibi-ha di nime ha, ọlu di n’aru ha: ha agaghi-abu ihe nātọ utọ n’ọnọdu unu.

26 Jehova we gwa Moses okwu, si,

27 Oke-ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu, mb͕e amuru ya, ọ gādi kwa n’okpuru nne-ya ubọchi asa; ma site n’ubọchi nke-asatọ we gaba ọ gābu ihe nātọ utọ ibu onyinye iji biaru nso nke àjà-ọku anāchuru Jehova.

28 Ehi ma-ọbu aturu, unu eb͕ula ya na nwa-ya n’otù ubọchi.

29 Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà-ekele, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.

30 N’otù ubọchi ahu ka agēri ya; unu emela ka ihe fọdu nime ya rue ututu: Mu onwem bu Jehova.

31 Unu gēdebe kwa ihe nile M’nyere n’iwu, unu gēme kwa ha: Mu onwem bu Jehova.

32 Unu eme-kwa-la ka aha nsọm ghara idi nsọ; ma agēdom nsọ n’etiti umu Israel: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ,

33 Nke nēme ka unu si n’ala Ijipt puta, ka M’we buru unu Chineke: Mu onwem bu Jehova.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 23

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nile akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa ha, ka ha buru nkpọkọta nsọ, ndia bu mb͕em akara àkà.

3 Ubọchi isi ka agēje ozi: ma n’ubọchi nke-asa, ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādi, bú nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ubọchi-izu-ike nke Jehova nwere ka ọ bu n’ebe-obibi-unu nile.

4 Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, bú nkpọkọta nsọ, nke unu gākpọsa na mb͕e-ha akara àkà.

5 N’ọnwa mbu, n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n’etiti ehihie na anyasi, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.

6 N’ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe achicha ekoghi-eko gādi-kwa-ra Jehova: ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko.

7 N’ubọchi mbu unu gēnwe nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

8 Ma unu gēweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova ubọchi asa: n’ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

9 Jehova we gwa Moses okwu, si,

10 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu bara n’ala nke Mu onwem nēnye unu, mb͕e unu gēwe kwa ihe-ubi-ya, unu gēweta-kwa-ra onye-nchu-àjà ùkwù nke ihe mbu nke owuwu-ihe-ubi-unu:

11 ọ gēfé kwa ùkwù ahu n’iru Jehova, ka unu we buru ihe nātọ utọ: n’echi nke ubọchi-izu-ike ahu ka onye-nchu-àjà gēfé ya.

12 N’ubọchi unu nēfé ùkwù ahu, unu gēme nwa-ebulu nke zuru okè nke b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.

13 Onyinye-inata-iru-ọma-ya gābu uzọ abua n’uzọ iri nke ephah utu ọka flour agwara manu, bú àjà-ọku anāchuru Jehova ibu ísì utọ: àjà-ihe-ọṅuṅu-ya gābu kwa manya-vine, otù uzọ n’uzọ anọ nke hin.

14 Unu eri-kwa-la achicha, ma-ọbu ọka aṅara aṅa, ma-ọbu ọka rara oko, rue otù ubọchi a, rue mb͕e unu wetara onyinye iji biaru nso nke Chineke-unu: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n’ebe-obibi-unu nile.

15 Unu gāgu-kwa-ra onwe-unu site n’echi nke ubọchi-izu-ike ahu, site n’ubọchi unu butere ùkwù nke àjà-ofufé; ubọchi-izu-ike asa zuru okè gādi:

16 rue echi nke ubọchi-izu-ike nke-asa ka unu gāgu ọgu ubọchi abua na iri, unu gēweta kwa nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu.

17 Unu gēsite n’ebe-obibi-unu weta ob͕e achicha abua nke àjà-ofufé, nke uzọ abua n’uzọ iri nke ephah: utu ọka flour ka ha gābu, ihe nēko achicha ka agēji si ha, iburu Jehova nkpuru mbu.

18 Unu gēweta kwa nso umu-aturu asa ndi zuru okè nke b͕ara otù arọ, na otù nwa-oke-ehi, na ebulu abua, tiyere achicha ahu: ha gābu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova, ha na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

19 Unu gēme kwa otù nkpi ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa umu-ebulu abua nke b͕ara otù arọ ka ha buru ihe àjà nke àjà-udo.

20 Onye-nchu-àjà gēfé kwa ha tiyere achicha nke nkpuru mbu ka ha buru àjà-ofufé n’iru Jehova tiyere umu-aturu abua ahu: nsọ ka ha gādiri Jehova n’ebe onye-nchu-àjà nọ.

21 Unu gākpọsa kwa òkù n’otù ubọchi ahu; nkpọkọta nsọ gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu n’ebe-obibi-unu nile rue ọbọ-unu nile.

22 Mb͕e unu nēwe ihe-ubi nke ala-unu ewesila ihe di n’akuku ubi-gi mb͕e i nēwe ihe-ubi-gi, achikọta-kwa-la ihe-nchikọta nke owuwe-ihe-ubi-gi fọduru: ob͕eye na ọbìa ka i gārapuru ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

23 Jehova we gwa Moses okwu, si,

24 Gwa umu Israel okwu, si, N’ọnwa nke-asa, n’ubọchi mbu nke ọnwa ahu, idebe-ubọchi-izu-ike gādiri unu, ncheta nke uda-opì nādasi ike, nkpọkọta nsọ.

25 Ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova.

26 Jehova we gwa Moses okwu, si,

27 Otú ọ di, n’ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka ka ubọchi nkpuchi-nmehie gādi: nkpọkọta nsọ ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n’ala; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova.

28 Ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje n’otu ubọchi ahu: n’ihi na ubọchi nkpuchi-nmehie ka ọ bu, ikpuchiri unu nmehie-unu n’iru Jehova, bú Chineke-unu.

29 N’ihi na madu ọ bula nke anewedaghi n’ala n’otù ubọchi ahu, agēbipu ya n’etiti umu-nna-ya.

30 Ma madu ọ bula nke nēje ozi ọ bula n’otù ubọchi ahu, M’gēme ka madu ahu si n’etiti ndi-ya la n’iyì.

31 Ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n’ebe-obibi-unu nile.

32 Ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n’ala: n’ubọchi nke-iteghete nke ọnwa n’anyasi, site n’anyasi rue anyasi, ka unu gēdebe ubọchi-izu-ike-unu.

33 Jehova we gwa Moses okwu, si,

34 Gwa umu Israel okwu, si, N’ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa nka ka ememe ulo-ntu gādiri Jehova ubọchi asa.

35 N’ubọchi mbu nkpọkọta nsọ gādi: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

36 Ubọchi asa unu gēweta nso àjà-ọku ichuru Jehova: n’ubọchi nke-asatọ nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova: ubọchi nb͕ochi ka ọ bu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

37 Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa, ka ha buru nkpọkọta nsọ, iweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nke ubọchi n’ubọchi-ya:

38 nāgughi ubọchi-izu-ike nile nke Jehova, nāgughi kwa onyinye nile unu, nāgughi kwa nkwa-unu nile, nāgughi kwa onyinye-afọ-ofufo-unu nile, nke unu nēnye Jehova.

39 Otú ọ di, n’ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa ahu, mb͕e unu chikọtasiri ihe-ọmume nke ala ahu, unu gēme ememe Jehova ubọchi asa: n’ubọchi mbu idebe-ubọchi-izu-ike gādi, n’ubọchi nke-asatọ idebe-ubọchi-izu-ike gādi kwa.

40 Unu gāchiri kwa n’onwe-unu n’ubọchi mbu nkpuru nke osisi ọma, na igu nkwu, na alaka osisi b͕ara ọhia, na osisi willow nke miri-iyi; unu gaṅuri kwa ọṅu n’iru Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi asa.

41 Unu gēme kwa ya dika ememe emere Jehova ubọchi asa n’arọ: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile: n’ọnwa nke-asa ka unu gēme ya.

42 N’ulo-ntu ka unu gēbi ubọchi asa; ndi nile amuru n’ala n’Israel gēbi n’ulo-ntu:

43 ka ọb͕ọ-unu nile we mara na ọ bu n’ulo-ntu ka M’mere umu Israel ka ha biri, mb͕e M’mere ka ha si n’ala Ijipt puta: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

44 Moses we gwa umu Israel mb͕e nile akara àkà nke Jehova.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 24

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Nye umu Israel iwu, ka ha wetara gi manu olive anāgwaghi agwa nke asuru asu, itiye n’ihe nēnye ìhè, iweli oriọna mb͕e dum.

3 N’èzí ákwà-nb͕ochi nke ihe-àmà, n’ulo-ikwū nzute, ka Eron gēdo ya n’usoro site n’anyasi rue ututu n’iru Jehova mb͕e dum: ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile.

4 N’elu ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka ọ gēdo oriọna nile n’usoro n’iru Jehova mb͕e dum.

5 Ọzọ, i gēwere utu ọka flour, sie ya ka ọ buru ob͕e achicha iri na abua: uzọ abua n’uzọ iri nke ephah gādiri otù ob͕e achicha.

6 I gēdo kwa ha n’usoro abua, isi n’otù usoro, n’elu table nke ọla-edo anāgwaghi agwa n’iru Jehova.

7 I gētiye kwa frankincense anāgwaghi agwa n’elu usoro ọ bula, ka ọ we ghọrọ achicha ahu ihe-ncheta, bú àjà-ọku anāchuru Jehova.

8 Kwa-ubọchi-izu-ike o gēdo ya n’usoro n’iru Jehova mb͕e dum; o sitere n’umu Israel, ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ bu.

9 Ọ gādiri Eron na umu-ya ndikom; ha gēri ya n’ebe di nsọ n’ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru ya sitere n’àjà-ọku nile nke Jehova, ọ bu ukpuru ebighi-ebi.

10 Nwa-nwoke nke nwayi Israel, nwoke ahu bu kwa nwa nke nwoke Ijipt, we pua je n’etiti umu Israel: nwa-nwoke nke nwayi Israel ahu na otù onye Israel we lua ọ̀gù n’ọmuma-ulo-ikwū;

11 nwa-nwoke nke nwayi Israel ahu we kpọlu Aha ahu, kọcha kwa: ha we me ka ọ biakute Moses. Aha nne-ya bu Shelomit, nwa-nwayi Dibri, nke ebo Dan.

12 Ha we me ka ọ nọdu n’ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, ka ewe kọrọ ha ala okwu ahu n’ọnu Jehova.

13 Jehova we gwa Moses, okwu, si,

14 Me onye ahu nākọcha akọcha ka ọ pua je n’azu ọmuma-ulo-ikwū; ndi nile nke nuru olu-ya gēbikwasi aka-ha n’isi-ya, nzukọ nile gātub͕u ya na nkume.

15 I gāgwa kwa umu Israel okwu, si, Onye ọ bula, mb͕e ọ nākọcha Chineke-ya, o gēbu nmehie-ya.

16 Onye nākpọlu kwa aha Jehova, aghaghi ime ka ọ nwua; nzukọ Israel nile aghaghi itub͕u ya na nkume: dika anēme ọbìa, otú a ka agēme onye amuru n’ala, mb͕e ọ nākpọlu aha Jehova agēme ka ọ nwua.

17 Onye ọ bula mb͕e ọ gētipu ndu madu, aghaghi ime ka ọ nwua;

18 Onye nētipu kwa ndu anu-ulo gākwughachi ya: ndu lara ndu.

19 Ọzọ, onye ọ bula, mb͕e ọ gēme ka ọlu di n’aru madu-ibe-ya; dika ọ meworo, otú a ka agēme ya;

20 nkpaji lara nkpaji, anya lara anya, ezé lara ezé: dika o meworo ka ọlu di n’aru madu, otú a ka agēme ka ọlu di n’aru ya.

21 Onye nētib͕u anu-ulo gākwughachi ya: ma onye nētib͕u madu, agēme ka ọ nwua.

22 Otù ikpé diri unu, dika anēkpe ọbìa, otú a ka agēkpe onye amuru n’ala: n’ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

23 Moses we gwa umu Israel okwu, ha we me onye ahu nākocha akọcha ka ọ pua je n’azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we tub͕ue ya na nkume. Umu Israel we me dika Jehova nyere Moses iwu.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 25

1 Jehova we gwa Moses okwu n’ugwu Sainai, si,

2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n’ala nke Mu onwem nēnye unu, ala ahu gēdebe-kwa-ra Jehova ubọchi-izu-ike.

3 Arọ isi ka i gāgha nkpuru n’ubi-gi, arọ isi ka i gākwacha osisi ubi-vine-gi, chikọta kwa ihe-ọmume-ya;

4 ma n’arọ nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādiri ala ahu, bú ubọchi-izu-ike agēdebere Jehova: aghala nkpuru n’ubi-gi, akwacha-kwa-la osisi ubi-vine-gi.

5 Ewela ihe-ubi-gi nke nēpu n’onwe-ya, aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine gi nke anākwachaghi akwacha: arọ nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ gāburu ala ahu.

6 Ubọchi-izu-ike nke ala ahu gābu-kwa-ra unu ihe-oriri; ọ gāburu gi, buru kwa orù-gi nwoke, buru kwa orù-gi nwayi, buru kwa onye i goro ọlu, buru kwa onye nānọdu n’ulo-gi, bú ndi nọyere gi dika ọbìa;

7 anu-ulo-gi, na anu-ọhia nke di n’ala-gi, gēnwe kwa ihe-ọmume-ya nile n’ihe-oriri.

8 I gāgu-kwa-ra onwe-gi ubọchi-izu-ike asa, bú arọ, arọ asa ub͕ò asa; ubọchi nke ubọchi-izu-ike asa, bú arọ arọ, gābu-kwa-ra gi ọgu arọ abua na iteghete.

9 I gēme kwa ka opì-ike nke nādasi uda ike gābiga rue ebe nile n’ọnwa nke-asa, n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu; n’ubọchi nkpuchi-nmehie ka unu gēme ka opì-ike gabiga n’ala-unu nile.

10 Unu gēdo kwa arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu nsọ, kpọsa kwa n’ala ahu nile si na ndi nile bi nime ya nwere onwe-ha: jubile ka arọ ahu gāburu unu; unu gālaghachi kwa, onye ọ bula n’ihe-onwunwe-ya, laghachi kwa, onye ọ bula n’ab͕uru-ya.

11 Jubile ka arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu gāburu unu: unu aghala nkpuru, unu ewe-kwa-la ihe-ubi nēpu n’onwe-ya nime ya, unu aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine nile anākwachaghi akwacha.

12 N’ihi na jubile ka ọ bu; nsọ ka ọ gādiri unu: unu gēsite n’ubi rie ihe-ọmume-ya.

13 N’arọ jubile a ka unu gālaghachi, onye ọ bula n’ihe-onwunwe-ya.

14 Mb͕e i gērenye madu-ibe-gi ihe-orire, ma-ọbu zuru ihe n’aka madu-ibe-gi, unu emeritala onwe-unu ihe-ike:

15 dika ọnu-ọgugu arọ si di site n’arọ jubile, otú a ka i gāzuru ihe n’aka madu-ibe-gi, dika ọnu-ọgugu arọ ihe-ọmume si di, otú a ka ọ gērenye gi.

16 Dika iba-uba nke arọ si di ka i gēme ka ọnu-ahia-ya ba uba, ọ bu kwa dika nbilata arọ si di ka i gēbilata ọnu-ahia-ya; n’ihi na ọnu-ọgugu ihe-ọmume ka ya onwe-ya nērenye gi.

17 Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n’ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi.

18 Unu gēme kwa ukpurum nile, ikpém nile ka unu gēdebe kwa, me kwa ha; unu gēbi kwa n’ala ahu na ntukwasi-obi.

19 Ala ahu gāmi nkpuru-ya, unu gēriju afọ, biri nime ya na ntukwasi-obi.

20 Ma mb͕e unu gāsi, Gini ka ayi gēri n’arọ nke-asa? le, ayi agaghāgha nkpuru, ayi agaghi-achikọta kwa ihe-ọmume-ayi:

21 M’gēnye kwa ngọzim iwu idakwasi unu n’arọ nke-isi, ọ gēme-kwa-ra arọ atọ ahu ihe-ọmume.

22 Unu gāgha kwa nkpuru n’arọ nke-asatọ, rie ufọdu nime ihe-ọmume ahu, bú ihe ochie; rue arọ nke-iteghete, rue mb͕e ihe-ọmume-ya gābata, unu gēri ihe ochie.

23 Agaghi-ere ala ahu rue mb͕e ọ gādiru n’ihi na Mu nwe ala ahu: n’ihi na ndi-ọbìa na ndi-nnọdu ka unu bu n’alam.

24 N’ala nile nke ihe-onwunwe-unu unu gēnye kwa ihe-nb͕aputa bayere ala ahu.

25 Mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, we re ufọdu nime ihe-onwunwe-ya, onye-nb͕aputa-ya nke bu onye-aru-ya gābia kwa, b͕aputa ihe nwa-nne-ya reworo.

26 Onye ọ bula, mb͕e ọ nēnweghi onye-nb͕aputa, ma aka-ya eruwo, ọ we huta ihe gēzu nb͕aputa-ya;

27 ya gu kwa arọ nile nke orire-ya, nyeghachi nwoke ọ renyere ya ihe fọduru; ọ gālaghachi kwa n’ihe-onwunwe-ya.

28 Ma mb͕e aka-ya achọtaghi ihe gēzu inweghachi ya n’onwe-ya, ihe ọ reworo gādi kwa n’aka onye zuworo ya rue arọ jubile: ma na jubile ahu ọ gāpu, ọ gālaghachi kwa n’ihe-onwunwe-ya.

29 Ọzọ, onye ọ bula, mb͕e ọ gēre ulo-obibi n’obodo nwere mb͕idi buruburu, nb͕aputa-ya gādi kwa rue mb͕e arọ orire-ya gēruzù; otù nb͕a-arọ ka nb͕aputa-ya gādi.

30 Ma ọ buru na ab͕aputaghi ya rue mb͕e ọ nwezuru arọ zuru okè, ulo ahu nke di nime obodo nwere mb͕idi buruburu gēguzosi-kwa-ra onye nāzú ya ike rue mb͕e ọ gādiru, rue ọb͕ọ-ya nile: ọ gaghi-apu na jubile.

31 Ma ulo nile nke obodo ntà nēnweghi mb͕idi buruburu, tiyere ọhia nke ala ahu ka agāgu ha, nb͕aputa diri ha, na jubile ka ha gāpu kwa.

32 Ma obodo nile nke ndi Livai, ulo nile nke obodo nile nke ihe-onwunwe-ha, ike nb͕aputa ebighi-ebi ka ndi Livai gēnwe.

33 Ma asi na ọnye ọ bula nime ndi Livai ab͕aputa ihe, ulo nke ereworo, na obodo nke ihe-onwunwe-ya, gāpu kwa na jubile: n’ihi na ulo nile nke obodo nile nke ndi Livai bu ihe-onwunwe-ha n’etiti umu Israel.

34 Ma agaghi-ere ọhia nke ebe-ita-nri nke obodo-ha; n’ihi na ihe-onwunwe ebighi-ebi ka ọ buru ha.

35 Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, aka-ya ewe ghara idi ike n’ebe-obibi-gi; i gēye-kwa-ra ya aka: dika ọbìa na onye-nnọdu ka ọ gābu, o gēbiyere kwa gi.

36 Anarala ya uma ma-ọbu ọmuru-nwa; ma tua egwu Chineke-gi: ka nwa-nne-gi we biyere gi.

37 Enyela ya ego-gi n’uma, enye-kwa-la ya ihe-oriri-gi n’ọmuru-nwa.

38 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n’ala Ijipt puta, inye unu ala Kenean, iburu unu Chineke.

39 Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye n’ebe-obibi-gi, we renye gi onwe-ya; emela ka ọ fè òfùfè nke orù:

40 dika onye egoro ọlu, dika onye-nnọdu, ka ọ gānọ n’aka-gi; rue arọ jubile ka ọ gēfè òfùfè n’aka-gi:

41 o gēsi kwa n’aka-gi pua, ya onwe-ya na umu-ya tiyere ya, ọ gālaghachikuru kwa ab͕uru-ya, ihe-onwunwe nke nna-ya-hà ka ọ gālaghachikuru kwa.

42 N’ihi na ndi-orùm ka ha bu, ndi M’mere ka ha si n’ala Ijipt puta: agaghi-ere ha dika anēre orù.

43 Ewela nkpab͕u zọda ya; ma tua egwu Chineke-gi.

44 Ma orù-gi ndikom na orù-gi ndinyom, ndi i gēnwe; site n’aka mba nile nke di unu buruburu, site n’aka-ha ka unu gāb͕ata orù-ndikom na orù-ndinyom.

45 Ọzọ kwa, ufọdu nime umu ndi-nnọdu ndi nọ dika ọbìa n’ala-unu, ufọdu nime ha ka unu gāb͕ata, na ufọdu nime ab͕uru-ha ndi nọ n’ala-unu ndi ha muru n’ala-unu: ha gābu-kwa-ra unu ihe-onwunwe.

46 Unu gēme ha ka ha buru ihe-nketa umu-unu ndi gānochi unu gēnwe, inweta dika-onwunwe; rue mb͕e ebighi-ebi ufọdu nime ndi ahu ka unu gēme ka ha buru orú-unu: ma unu ewela nkpab͕u zọda umu-nne-unu, bú umu Israel, nāzọdarita onwe-unu n’otù n’otù.

47 Ọzọ, mb͕e aka ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n’ala-unu gēru inwe àkù, ma nwa-nne-gi adawo ob͕eye n’akuku-ya, were onwe-ya renye ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n’ala-gi, ma-ọbu were onwe-ya renye onye bayere nkpọrọgwu n’ab͕uru ọbìa:

48 mb͕e eresiri ya, nb͕aputa diri ya; otù onye nke sitere n’umu-nne-ya gāb͕aputa ya:

49 ma-ọbu nwa-nne nna-ya, ma-ọbu nwa nwa-nne nna-ya, gāb͕aputa ya; ma-ọbu onye-aru-ya site n’ab͕uru-ya gab͕aputa ya; ma ọ buru na aka-ya erue inwe àkù, ọ gāb͕aputa onwe-ya.

50 Ya na onye b͕aworo ya gāgu kwa site n’aro ọ were onwe-ya renye ya rue arọ jubile: ego orire-ya gādi kwa ka ọnu-ọgugu arọ; dika ubọchi nile nke onye egoro ọlu ka ọ gānọ n’aka-ya.

51 Ọ buru na ọtutu arọ fọduru, dika ha si di ka ọ gēsite n’ego orire-ya nyeghachi ihe-nb͕aputa-ya.

52 Ma ọ buru na ole-na-ole fọduru n’arọ rue arọ jubile, ọ gāgu-kwa-ra ya; dika arọ-ya nile si di ka ọ gēnyeghachi ihe-nb͕aputa-ya.

53 Dika onye egoro ọlu kwa-arọ ka ọ gānọ n’aka-ya, ọ gaghi-ewere nkpab͕u zọda ya n’anya-gi.

54 Ma ọ buru na ab͕aputaghi ya n’arọ ndia, ọ gābu kwa n’arọ jubile, ya onwe-ya, na umu-ya tiyere ya.

55 N’ihi na Mu ka umu Israel buru ndi-orù; ndi-orùm ka ha bu ndi M’mere ka ha si n’ala Ijipt puta: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 26

1 Unu emerela onwe-unu ihe-efu ọ bula, unu eguzoro-kwa-la onwe-unu arusi apiri api, ma-ọbu ogidi, unu etiye-kwa-la nkume emere ka o yie ihe n’ala-unu, ikpọ isi ala nye ya: n’ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

2 Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova.

3 Ọ buru na unu ejeghari n’ukpurum nile, ọ buru kwa na unu edebe ihe nile M’nyere n’iwu, we me ha:

4 M’gēnye kwa miri-ozuzo-unu na mb͕e-ha, ala gāmi kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ọhia gāmi kwa nkpuru-ha.

5 Nzọcha-ọka-unu gēru ọghughọ-nkpuru-vine, ọghughọ-nkpuru-vine gēru kwa ọghigha-nkpuru: unu gēriju nri-unu afọ, biri kwa n’ala-unu na ntukwasi-obi.

6 M’gēnye udo n’ala, unu gēdina kwa ala, ọ dighi kwa onye ganēme ka unu ma jijiji: M’gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n’ala, mma-agha agaghi-agabiga kwa n’ala-unu.

7 Unu gāchu ndi-iro-unu, ha gāda kwa n’iru unu site na mma-agha.

8 Madu ise n’etiti unu gāchu ọgu madu ise, ọgu madu ise n’etiti unu gāchu kwa orú nnù madu na nnù madu ise: ndi-iro-unu gāda kwa n’iru unu site na mma-agha.

9 M’gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M’gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n’ebe unu nọ.

10 Unu gēri ihe ochie nke anēdebe site na mb͕e ochie, unu gēweputa kwa nke-ochie n’iru nke-ọhu.

11 M’gētiye ebe-obibim n’etiti unu: nkpuru-obim agaghi-asọ kwa unu oyi.

12 M’ganējeghari n’etiti unu, M’gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi.

13 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n’ala Ijipt, si kwa n’iburu ha ndi-orù, puta; M’tijiwo kwa nkpọrọ nile nke yoke-unu, me kwa ka unu je ije iguzo-ọtọ.

14 Ma ọ buru na unu egeghm nti, unu ewe ghara ime ihe nile ndia M’nyere n’iwu;

15 ọ buru kwa na unu aju ukpurum nile, ọ buru kwa na nkpuru-obi-unu asọ ikpém nile oyi, unu ewe ghara ime ihe nile M’nyere n’iwu, ka unu we mebie ọb͕ub͕a-ndum;

16 Mu onwem gēme kwa unu nka; M’gēme obi-ọlulọ-miri ka ọ buru onye-nlekọta-unu, bú ọtita-aru na aru-ọku, nēme ka anya-unu hubìe uzọ, nēme kwa ka nkpuru-obi-unu b͕azepu: unu gāgha kwa nkpuru-unu n’efu, ndi-iro-unu gēri kwa ya.

17 M’gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n’iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu.

18 Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti rue ihe ndia, M’gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa ọzọ n’ihi nmehie nile unu.

19 M’egetiji nweli-elu nke ike-unu; M’gēme kwa elu-igwe-unu ka ọ di ka ígwè, me kwa ala-unu ka ọ di ka ọla:

20 ike-unu gāgwu kwa n’efu: ala-unu agaghi-ami kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ala agaghi-ami kwa nkpuru-ha.

21 Ma ọ buru na unu ejeghari n’imegidem, we ghara ikwe igem nti; M’gātukwasi kwa unu ihe-otiti ub͕ò asa ọzọ dika nmehie-unu nile si di.

22 M’gēzite anu-ohia n’etiti unu, ha gēme kwa ka unu b͕a aka umu, ha gēb͕upu kwa anu-ulo-unu, me kwa ka unu di ole-na-ole, uzọ nile unu gātọb͕ọ kwa n’efu.

23 Ma ọ buru na adọghi unu aka na nti n’ebe M’nọ site n’ihe ndia, ma unu nējeghari n’imegidem;

24 Mu onwem gējeghari kwa n’imegide unu; M’gēti kwa unu ihe ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n’ihi nmehie nile unu.

25 M’gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M’gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n’etiti unu; agēnye kwa unu n’aka ndi-iro.

26 Mb͕e M’gākpajiri unu nkpa-n’aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n’otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n’ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu.

27 Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti n’ihe a, ma unu nējeghari n’imegidem;

28 M’gējeghari kwa n’imegide unu n’ọnuma; M’gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n’ihi nmehie nile unu.

29 Unu gēri anu-aru umu-unu ndikom, anu-aru umu-unu ndinyom ka unu gēri kwa.

30 M’gēme ka ebe di elu nke unu tọb͕ọrọ n’efu, M’gēb͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, tukwasi kwa ozu-unu n’ozu nile nke arusi-unu; nkpuru-obim gāsọ kwa unu oyi.

31 M’gēme obodo nile unu nkpọnkpọ ebe, me kwa ebe nsọ unu ka ha tọb͕ọrọ n’efu, M’gaghi-anu kwa ísì utọ unu.

32 Mu onwem gēme kwa ala-unu ka ọ tọb͕ọrọ n’efu: ibobo ya gānwu kwa ndi-iro-unu n’aru, bú ndi di nime ya.

33 Unu ka M’gēfesa kwa n’etiti mba nile, M’gāmipu kwa mma-agha chua unu n’azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n’efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.

34 Mb͕e ahu ka ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ ala ahu utọ ubọchi nile nke itọb͕ọ-n’efu ahu, mb͕e unu onwe unu nọ kwa n’ala ndi-iro-unu; mb͕e ahu ka ala gākwusi n’ọlu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ.

35 Ubọchi nile nke itọb͕ọ-n’efu ahu ka ọ gākwusi n’ọlu: nke ọ nākwusighi n’ubọchi-izu-ike-unu, mb͕e unu biri n’elu ya.

36 Ma ndi nāfọdu n’etiti unu, M’gēme ka ida-mbà ba n’obi-ha n’ala ndi-iro-ha: olu nke akwukwọ-osisi ifufe nēfepu gāchu kwa ha; ha gāb͕alaga nb͕alaga mma-agha; ha gāda kwa mb͕e ọ dighi onye nāchu ha.

37 Ha gāsurita ngọngọ, otù n’aru ibe-ya, dika n’iru mma-agha, mb͕e onye nāchu ha adigh: ma nguzosi-ike n’iru ndi-iro-unu agaghi-adiri unu.

38 Unu gāla kwa n’iyì n’etiti mba nile ọzọ, ala ndi-iro-unu gēri kwa unu.

39 Ndi nāfọdu n’etiti unu gāta aru n’ajọ omume-ha n’ala nile nke ndi-iro-unu; ọzọ kwa, n’ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha, ha gēso kwa ha ta aru.

40 Ha gēkwuputa ajọ omume-ha, na ajọ omume nke ndi bu nna-ha, nime nmekpu-ha nke ha mekpurum, ha gēkwuputa kwa na n’ihi na ha jeghariri n’imegidem,

41 Mu onwem we nējeghari kwa n’imegide ha, me ka ha ba n’ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu;

42 M’gēcheta kwa ọb͕ub͕a-ndu Mu na Jekob b͕ara; ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Aisak b͕ara, ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Abraham b͕ara, ka M’gēcheta; ala ahu ka M’gēcheta kwa.

43 Ha gārapu kwa ala ahu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ, n’itọb͕ọ-n’efu ahu mb͕e ha nānọghi ya; ahuhu ajọ omume-ha gātọ kwa ha onwe-ha utọ: n’ihi na, ọbuná n’ihi na ikpém nile ka ha juru, ọ bu kwa ukpurum nile ka nkpuru-obi-ha sọrọ oyi.

44 Ma ọbuna n’ihe a kwa, mb͕e ha nọ n’ala ndi-iro-ha, M’gaghi-aju ha, M’gaghi-asọ kwa ha oyi, ime ka ha gwusia, na imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ha b͕ara: n’ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke ha:

45 M’gēcheta kwa n’ihi ha ọb͕ub͕a-ndu nke ndi-mbu-ha, ndi M’mere ka ha si n’ala Ijipt puta n’anya mba nile ọzọ, ka M’we buru ha Chineke: Mu onwem bu Jehova.

46 Ndia bu ukpuru na ikpé na iwu, nke Jehova nyere n’etiti Ya na umu Israel n’ugwu Sainai site n’aka Moses.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 27

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e onye ọ bula gēmezu nkwa, dika okwu si di ka madu nile gāburu Jehova.

3 Ọgugu ọnu gi gābu kwa nke nwoke site n’onye b͕ara orú arọ we rue onye b͕ara ọgu aro atọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa ọgu shekel ọla ọcha abua na iri, dika shekel nke ebe nsọm si di.

4 Ma ọ buru na nwayi ka ọ bu, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa orú shekel na iri.

5 Ma ọ buru na ọ bu site n’onye b͕ara arọ ise we rue onye b͕ara orú arọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi nke nwoke gābu kwa orú shekel, ma ọ gāburu nwayi shekel iri.

6 Ma ọ buru na ọ bu site n’onye ruru otù ọnwa we rue onye b͕ara arọ ise, ọ̀rùrù-ọnu-gi nke nwoke gābu kwa shekel ọla-ọcha ise, ma shekel ọla-ọcha atọ ka ọ̀rùrù-ọnu-gi gāburu nwayi.

7 Ma ọ buru na ọ bu site n’onye b͕ara ọgu arọ atọ we gaba n’iru; ọ buru na ọ bu nwoke, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa shekel iri na ise, ma ọ gāburu nwayi shekel iri.

8 Ma ọ buru na onye dara ob͕eye ka ọ bu kari ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēguzo kwa ya n’iru onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu; dika aka onye ahu nke nēkwe nkwa ruru ka onye-nchu-àjà gārù ya ọnu.

9 Ma ọ buru na ọ bu anu-ulo, nke madu nēsite na ya weta nso Jehova onyinye iji biaru nso, ihe ọ bula madu gēsite na ya nye Jehova gādi nsọ.

10 Ọ gaghāb͕anwe ya, ọ gaghi-enwo kwa ya, ezi ihe n’ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu ihe ọjọ n’ọnọdu ezi ihe: ma ọ buru na o were anu-ulo nwo anu-ulo ma-ọli nke ahu di kwa nsọ, ihe eji nwo ya gādi kwa nsọ.

11 Ma ọ buru na ọ bu anu-ulo ọ bula ruru árú, nke ha nēsiteghi na ya weta nso Jehova onyinye iji biaru nso, ọ gēme kwa ka anu-ulo ahu guzo n’iru onye-nchu-àjà:

12 onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ: dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, gi onye-nchu-àjà, otú a ka ọ gādi.

13 Ma ọ buru na ọ gāb͕aputa ya n’ezie, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n’uzọ ise ya n’ọ̀rùrù-ọnu-gi.

14 Ọzọ, mb͕e onye ọ bula gēdo ulo-ya nsọ idiri Jehova nsọ, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ulo ma-ọbu ulo ọjọ: dika onye-nchu-àjà gārù ya ọnu, otú a ka o gēguzo.

15 Ọ buru kwa na onye ahu nke nēdo ya nsọ ab͕aputa ulo-ya, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n’uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, ọ gābu kwa nke ya.

16 Ma ọ buru na onye ọ bula ewere ufọdu nime ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya doro Jehova nsọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gādi kwa ka nkpuru-ọghigha-ya si di; otù homer nke nkpuru-ọghigha ọka barley, agārù ọnu-ya n’ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri.

17 Ọ buru na o sitere n’arọ jubile do ala-ubi-ya nsọ, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di ka o gēguzo.

18 Ma ọ buru na o do ala-ubi-ya nsọ mb͕e jubile gasiri, onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ego-ya dika arọ fọduru iru arọ jubile si di, agāgubì kwa ihe n’ọ̀rùrù-ọnu-gi.

19 Ma ọ buru na onye ahu nke nēdo ala-ubi nsọ ab͕aputa ya n’ezie, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n’uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēme kwa ka o guzosiere ya ike.

20 Ma ọ buru na ọ b͕aputaghi ala-ubi ahu, ma-ọbu na ọ renyewo onye ọzọ ala-ubi ahu, agaghi-ab͕aputa ya ọzọ:

21 ma ala-ubi ahu, n’òpùpù-ya nime jubile, gādiri Jehova nsọ, dika ala-ubi nke ewezugara ka ebibie ya; onye-nchu-àjà gēnwe ihe-onwunwe ala-ubi ahu.

22 Ma ọ buru na o doro Jehova ala-ubi ọ zuworo nsọ, bú nke nēsiteghi n’ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya;

23 onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ọgugu nke ọ̀rùrù-ọnu-gi rue arọ jubile: ọ gēnye kwa ọ̀rùrù-ọnu-gi n’ubọchi ahu, dika ihe nsọ diri Jehova.

24 N’arọ jubile ala-ubi ahu gālaghachiri onye azutara ya n’aka-ya, bú onye nwe ihe-onwunwe nke ala ahu.

25 Ọ̀rùrù-ọnu-gi nile gādi kwa ka shekel nke ebe nsọ si di: orú gerah gābu shekel ahu.

26 Nání nwa eburu uzọ mu n’etiti anu-ulo, nke anēme ka ọ buru nwa eburu uzọ muru Jehova, ọ dighi onye ọ bula gēdo ya nsọ: ma ọ bu ehi ma-ọbu aturu, ihe Jehova nwere ka ọ bu.

27 Ma ọ buru na ọ di n’etiti anu-ulo ruru árú, ọ gāb͕aputa kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n’uzo ise ya: ma ọ buru na ab͕aputaghi ya, agēre kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di.

28 Nání, ọ dighi ihe ọ bula agēre ma-ọbu b͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke onye ọ bula gēwezugara Jehova ka ebibie ya, site n’ihe nile o nwere, site na madu na anu-ulo, ma-ọbu site n’ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya: ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru Jehova.

29 Ọ dighi onye ọ bula agāb͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke agēwezuga ka ebibie ya site n’etiti madu: aghaghi ime ka ọ nwua.

30 Otù uzọ n’uzọ iri ihe nile nke ala, site na nkpuru-ọghigha nke ala, ma ọbu site na nkpuru osisi, ihe Jehova nwere ka ọ bu: ọ bu ihe nsọ diri Jehova.

31 Ma ọ buru na onye ọ bula ab͕aputa ihe nime otù uzọ n’uzọ iri ihe-ya ma-ọli, otù uzọ n’uzọ ise ka ọ gātukwasi ya.

32 Otù uzọ kwa n’uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu nile, ihe ọ bula nke nāgabiga n’okpuru nkpa-n’aka, otù uzọ n’uzọ iri gābu ihe nsọ diri Jehova.

33 Ọ gaghi-etucha n’etiti ezi anumanu na anumanu ọjọ ọ gaghi-enwo kwa ya: ma ọ buru na o nwo ya ma-ọli, nke ahu di kwa nsọ ihe eji nwo ya gādi kwa nsọ; agaghi-agbnwe ya.

34 Ndia bu ihe enyere n’iwu, nke Jehova nyere Moses n’iwu bayere umu Israel n’ugwu Sainai.