Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 11

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si ha,

2 Gwanu umu Israel okwu, si, Ndia bu anu di ndu unu gēri n’etiti anumanu nile nke di n’elu uwa.

3 Anu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara, nke nātaghari kwa ọnu, n’etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri.

4 Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n’etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n’etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, n’ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ọ bughi ihe ukwu-ya wara njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu.

5 Coney kwa, n’ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ukwu-ya awaghi njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu.

6 Hare kwa, n’ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ukwu-ya awaghi njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu.

7 Ezì kwa, n’ihi na ihe ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara, ka ọ bu, ma ya onwe-ya adighi-ataghari ọnu, ihe ruru árú ka ọ buru unu.

8 Unu erila ihe sitere n’anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka; ihe ruru árú ka ha buru unu.

9 Ndia ka unu gēri n’etiti ihe nile nke di na miri: ihe ọ bula nke nwere ntù na akpilikpa nime miri, n’oké osimiri nile, na n’osimiri nile, ha ka unu gēri.

10 Ma ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa n’oké osimiri nile, na n’osimiri nile, site n’ihe nile nēnuputa na miri, site kwa n’anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke di nime miri, ihe-árú ka ha buru unu,

11 ihe-árú ka ha gābu-kwa-ra unu; unu erila ihe sitere n’anu-ha, unu gāgu kwa ozu-ha n’ihe-árú.

12 Ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa nime miri, ihe-árú ka ọ buru unu.

13 Ndia ka unu gāgu kwa n’ihe-árú n’etiti anu-ufe; agaghi-eri ha, ihe-árú ka ha bu: ugo, na ego-agwọ, na ugo-azù;

14 na ndab͕u, na agu-nkwọ di iche iche;

15 ugolo-ọma ọ bula di iche iche;

16 na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche;

17 na okwukwu ntà, na cormorant, na okwukwu oku;

18 na okwukwu nwere mpi, na okwolo, na udele;

19 na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu.

20 Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, nke nēje ije n’ukwu anọ, ihe-árú ka ọ buru unu.

21 Ma otú ọ di, ndia ka unu gēri n’etiti anu-ufe nile nēnuputa enuputa, nke nēje ije n’ukwu anọ, nke nwere ogwe-ukwu n’elu ukwu-ala-ha, iji nākwu ntù n’elu ala;

22 ndia ka unu gēri n’etiti ha; igurube di iche iche, na akpa-nkwu di iche iche, na nbuzu di iche iche, na ogugu di iche iche.

23 Ma anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, nke nwere ukwu anọ, ihe-árú ka ọ buru unu.

24 N’ihi ihe ndia ka unu gēme onwe-unu ndi ruru árú: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi:

25 onye ọ bula nke nēbu ihe sitere n’ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

26 Anumanu ọ bula nke bu ihe ukwu-ya wara njakpa, ma ọ bughi ihe ukwu-ya warara awara, ọ bughi kwa ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ha aka gāru árú.

27 Ihe ọ bula kwa nke nēje ije n’ọbu-aka-ya, n’etiti anu nile di ndu nke nēje ije n’ukwu anọ, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi.

28 Onye nēbu ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ihe ruru árú ka ha buru unu.

29 Ndia bu-kwa-ra unu ihe ruru árú n’etiti ihe nēnuputa enuputa, nke nēnuputa n’elu uwa: weasel, na oké, na agu-iyi di iche iche,

30 na ọba-miri, na ngwere-aghu, na ngwere, na ngwere-uzuzu, na owumagana.

31 Ndia buru unu ihe ruru árú n’etiti ihe nile nēnuputa enuputa: onye ọ bula nke nēmetu ha aka mb͕e ha nwuru anwu gāru árú rue anyasi.

32 Ihe ọ bula nke otù nime ha gādakwasi, mb͕e ha nwuru, ọ gāru kwa árú: ma ọ bu ihe osisi ọ bula, ma-ọbu uwe, ma-ọbu akpukpọ, ma-ọbu àkpà, ihe ọ bula nke eji ya eje ozi ọ bula, agētiye ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi; o we di ọcha.

33 Ihe ájá ọ bula nke otù nime ha gādabà nime ya, ihe ọ bula nke di nime ya gāru árú, ihe ájá ahu ka unu gētiwa kwa.

34 Nime ihe-oriri nile nke anēri, nke ahu nke miri di otú a gābiakwasi gāru árú: ihe-ọṅuṅu nile nke anāṅu nime ihe ọ bula di otú a gāru kwa árú.

35 Ihe ọ bula nke ihe si n’ozu-ha gādakwasi gāru kwa árú; ma ọ bu ite-ọku, ma-ọbu ekwu, agākwatu ya: ihe ruru árú ka ha bu, ihe ruru árú ka ba gābu-kwa-ra unu.

36 Ma otú ọ di, isi-iyi ma-ọbu olùlù-miri, bú nchikọta miri, gādi ọcha: ma onye nēmetu ozu-ha aka gāru árú.

37 Ma mb͕e ihe nke si n’ozu-ha gādakwasi nkpuru-ọghigha ọ bula nke anāgha agha, ihe di ọcha ka ọ bu.

38 Ma mb͕e agētiye miri n’elu nkpuru-ọghigha, ma ihe si n’ozu-ha adakwasi ya, ihe ruru árú ka ọ buru unu.

39 Ọzọ, mb͕e otù nime anumanu, nke buru unu ihe-oriri, gānwu; onye nēmetu ozu-ya aka gāru árú rue anyasi.

40 Onye nēri ufọdu nime ozu-ya gāsu uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: onye ahu nke nēbu ozu-ya gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi.

41 Ọzọ ihe ọ bula nke nēnuputa enuputa nke nēnuputa n’elu uwa, ihe-árú ka ọ bu; agaghi-eri ya.

42 Ihe ọ bula nke nēje ije n’afọ-ya, na ihe ọ bula nke nēje ije n’ukwu anọ, ma-ọbu ihe ọ bula nwere ọtutu ukwu, ọbuná ihe nile nēnuputa enuputa nke nēnuputa n’elu uwa, unu erila ha; n’ihi na ihe ruru árú ka ha bu.

43 Unu ejila ihe-nnuputa ọ bula nke nēnuputa enuputa me onwe-unu ka unu buru ihe-árú, unu eji-kwa-la ha meru onwe-unu, ewe were ha meru unu.

44 N’ihi na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu: unu gēdo kwa onwe-unu nsọ, we di nsọ; n’ihi na nsọ ka Mu onwem di: unu eji-kwa-la ihe-nnuputa ọ bula nke nākpu akpu n’elu uwa meru onwe-unu.

45 N’ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka unu si n’ala Ijipt rigoputa, iburu unu Chineke: unu gādi kwa nsọ, n’ihi na nsọ ka Mu onwem di.

46 Nka bu iwu nke anumanu, na nke anu-ufe, na nke anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu nime miri, na nke anu ọ bula nēnuputa enuputa n’elu uwa:

47 ka ewe kpa ókè n’etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha, na n’etiti anu di ndu anēri eri na anu di ndu anādighi-eri eri.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 12

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, si, Nwayi, mb͕e ọ gātu ime, mua nwa-nwoke, ọ gāru kwa árú ubọchi asa; dika ubọchi idi-na-nsọ nke isọ-uba-ya si di, otú a ka ọ gāru árú.

3 N’ubọchi nke-asatọ agēbì ya úgwù n’anu-aru nke api-ya.

4 Orú ubọchi na iri na atọ ka nwayi ahu gānọgide n’ọbara nke ime ya ka ọ di ọcha; ọ dighi ihe nsọ ọ bula ọ gēmetu aka, ọ gaghi-abà kwa n’ebe nsọ ahu, rue ozùzù ubọchi nile nke ime ya ka ọ di ọcha.

5 Ma ọ buru na ọ mua nwa-nwayi, ọ gāru kwa árú ízù ubọchi asa abua, dika n’idi-na-nsọ-ya; ọ bu kwa ọgu ubọchi atọ na isi ka ọ gānọgide n’ọbara nke ime ya ka ọ di ọcha

6 N’ozuzù ubọchi nile nke ime ya ka ọ di ọcha bayere nwa-nwoke, ma-ọbu bayere nwa-nwayi, ọ gēwetara onye-nchu-àjà nwa-aturu nke b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku, na nwa-kpalakwu-kwu, ma-ọbu nduru, ka ọ buru àjà-nmehie, rue ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute:

7 ọ gēweta kwa ya nso n’iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; agēme kwa ya ka ọ di ọcha site n’isi ọbara-ya. Nka bu iwu nke nwayi nke nāmu nwa, ma ọ bu nwoke ma-ọbu nwayi.

8 Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, ọ gēwere-kwa nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibe-ya ka ọ buru kwa àjà-nmehie: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agēme kwa ya ka ọ di ọcha.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 13

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

2 Madu, mb͕e ihe-otutó, ma-ọbu ọnyá, ma-ọbu ntupọ nke nēke uke, di n’akpukpọ nke anu-aru-ya, mb͕e ihe ahu gāghọ n’akpukpọ nke anu-aru-ya ihe-otiti ekpenta, agēme kwa ka ọ biakute Eron, bú onye-nchu-àjà, ma-ọbu biakute otù nime umu-ya ndikom, bú ndi-nchu-àjà:

3 onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu di n’akpukpọ nke anu-aru-ya: ma ọ buru na aji nke di n’ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọchā, ọ buru kwa na, n’ile ihe-otiti ahu anya, ọ di omimi kari akpukpọ anu-aru-ya, ihe-otiti ekpenta ka ọ bu: onye-nchu-aja gāhu kwa ya, si na ọ ruru árú.

4 Ma ọ buru na ntupọ ahu nke nēke uke di ọcha n’akpukpọ anu-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n’ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na aji-ya abanweghi ọcha, onye-nchu-àjà gēme-chibido onye nwere ihe-otiti ahu nime ulo abali asa:

5 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya anya n’ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu eguzo n’anya-ya, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n’akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ:

6 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n’ubọchi nke-asa ọzọ: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n’akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha; ọnyá efu ka ọ bu; ọ gāsu kwa uwe-ya, di ọcha.

7 Ma ọ buru na ọnya ahu aba aba nke-uku n’akpukpọ-aru-ya, mb͕e emesiri ka onye-nchu-àjà hu ya ime ka ọ di ọcha, ọ gēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya nke ub͕ò abua:

8 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọnyá ahu abawo aba n’akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ ruru árú: ekpenta ka ọ bu.

9 Mb͕e ihe-otiti ekpenta di n’aru madu, agēme kwa ka ọ biakute onye-nchu-àjà;

10 onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na ihe-otutó ọcha di n’akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ihe ahu emewo aji ka ọ b͕anwe ọcha, onyá nke anu-aru ndu adi kwa n’ihe-otutó ahu,

11 ekpenta site na mb͕e ochie ka ọ bu n’akpukpọ anu-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọ gaghi-emechibido ya nime ulo; n’ihi na onye ruru árú ka ọ bu.

12 Ọ buru kwa na ekpenta ab͕awaputa nke-uku n’akpukpọ-aru-ya, ekpenta ahu ewe kpuchie akpukpọ-aru nile nke onye nwere ihe-otiti ahu site n’isi-ya we rue ukwu-ala-ya, ọbuná ihe nile anya onye-nchu-àjà nāhu;

13 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ekpenta ekpuchiwo anu-aru-ya nile, ọ gāsi kwa na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: aru-ya nile ab͕anwewo ọcha: ọcha ka ọ di.

14 Ma n’ubọchi anāhu anu-aru ndu nime ya, ọ gāru árú.

15 Onye-nchu-àjà gāhu kwa anu-aru ndu ahu, si na ọ ruru árú: anu-aru ndu ahu, ihe ruru árú ka ọ bu: ekpenta ka ọ bu.

16 Ma-ọbu mb͕e anu-aru ndu ahu gātughari, b͕anwe ọcha, ọ gābiakute kwa onye-nchu-àjà,

17 onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọcha, onye-nchu-àjà gāsi na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: ọcha ka ọ di.

18 Ọzọ, anu-aru, mb͕e ihe-ofifi di nime ya n’akpukpọ-aru-ya, ma eme ka ọ la.

19 ihe-otutó ọcha we di n’ọnọdu ihe otiti ahu, ma-ọbu ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, agēme ka onye-nchu-àjà hu ya;

20 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọ di ala, n’ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji-ya ab͕anwewo kwa ọcha, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, n’ihe-ofifi ahu ka ọ b͕awaputaworo.

21 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú ya, ma, le, aji ọcha adighi nime ya, ọ dighi kwa ala kari akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, onye-nchu-àjà gēmechibido ya nime ulo ubọchi asa;

22 ma ọ buru na ọ ba aba nke-uku n’akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ka ọ bu.

23 Ma ọ buru na ntupọ ahu nke nēke uke eguzo n’ọnọdu-ya, ma ọ baghi aba, apa ihe-ofifi ahu ka ọ bu; onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha.

24 Ma-ọbu anu-aru, mb͕e ọku-ọruru di n’akpukpọ-aru-ya, mb͕e anu-aru ndu nke ọku-ọruru ahu gāghọ ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, ma-ọbu ọcha;

25 onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le, ọ buru na aji ab͕anwewo ọcha nime ntupọ ahu nēke uke, ọ di kwa omimi, n’ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; ekpenta ka ọ bu, n’ọku-ọruru ahu ka ọ b͕awaputaworo: onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu.

26 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú ya, ma, le, aji ọcha adighi nime ntupọ ahu nēke uke ọ dighi kwa ala kari akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi; onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa:

27 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n’ubọchi nke-asa: ọ buru na ọ ba aba nke-uku n’akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu.

28 Ma ọ buru na ntupọ nke nēke uke eguzo n’ọnọdu-ya ma ọ baghi aba n’akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi; ihe-otutó nke ọku-ọruru ahu ka ọ bu, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: n’ihi na apa ọku-ọruru ahu ka ọ bu.

29 Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ihe-otiti di n’aru-ya, n’isi ma-ọbu n’afu-ọnu,

30 onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu: ma, le ọ, buru na ọ di omimi, n’ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na aji nācha edo edo, nke di irighiri, di nime ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọria isi ka ọ bu, ekpenta nke isi ma-ọbu nke afu-ọnu ka ọ bu.

31 Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti nke ọria-isi ahu, ma, le, ọ dighi omimi, n’ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji oji adighi kwa nime ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ihe-otiti ọria-isi ahu nime ulo ubọchi asa:

32 onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu n’ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi ahu abaghi aba, ọ buru kwa na aji nke nācha edo edo adighi nime ya, ọ buru kwa na ọria-isi ahu adighi omimi, n’ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya,

33 agākọpu kwa isi-ya, ma, ọ gaghi-akọpu ọria-isi ahu: onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ọria-isi ahu ubọchi asa ọzọ:

34 onye-nchu-àjà gāhu kwa ọria-isi ahu n’ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi abaghi aba n’akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n’ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, di ọcha.

35 Ma ọ buru na ọria-isi-ya aba aba nke-uku n’akpukpọ-aru-ya mb͕e emesiri ka ọ di ọcha;

36 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ọria-isi abawo aba n’akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà agaghi-achọ aji nācha edo edo ahu; onye ruru árú ka ọ bu.

37 Ma ọ buru na ọria-isi ahu eguzowo n’anya-ya, ọ buru kwa na aji oji epuputawo nime ya; emewo ka ọria-isi ahu la, ọcha ka ọ di: onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha.

38 Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ntupọ di iche iche nke nēke uke, bú ntupọ nēke uke nke di ọcha, di n’akpukpọ anu-aru-ha;

39 onye-nchu-àjà gāhu kwa: ma, le, ọ buru na ntupọ di iche iche nke nēke uke acha ọcha inyoghi-inyoghi, bú nke di n’akpukpọ anu-aru-ha; ngwọ ka ọ bu, ọ b͕awa-putawo n’akpukpọ-aru-ya; ocha ka ọ di.

40 Ma onye ọ bula, mb͕e agiri-isi kwọchapuworo n’isi-ya, onye-isi-nkwọcha ka ọ bu; ọcha ka ọ di.

41 Ọ buru kwa na agiri-isi-ya akwọchapuwo n’isi-ya na nko iru-ya, onye egedege-iru-ya kwọchara akwọcha ka ọ bu: ọcha ka ọ di.

42 Ma mb͕e ihe-otiti nke di ọcha nācha ọbara di n’isi-nkwọcha ahu ma-ọbu n’egedege-iru ahu kwọchara akwọcha; ekpenta nke nāb͕awaputa n’isi-nkwọcha-ya, ma-ọbu n’egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, ka ọ bu.

43 Onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ihe-otutó nke ihe-otiti ahu di ọcha nācha ọbara-ọbara n’isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n’egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, dika ekpenta nke akpukpọ anu-aru si di, n’ile ya anya;

44 onye-ekpenta ka ọ bu, ihe ruru árú ka ọ bu: onye-nchu-àjà aghaghi isi na ọ ruru árú; n’isi-ya ka ihe-otiti-ya di.

45 Ma onye-ekpenta, nke ihe-otiti ahu di n’aru ya, uwe-ya nile gābu ihe dọwara adọwa, agiri-isi-ya ganātọpu kwa atọpu, o gēkpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ya nke-elu, nākpọ, si, Onye ruru árú, onye ruru árú.

46 Ubọchi nile nke ihe-otiti ahu di n’aru ya ka ọ gāru árú; onye ruru árú ka ọ bu: ọ gēbi iche; n’azu ọmuma-ulo-ikwū ka ebe-obibi-ya gābu.

47 Uwe kwa, mb͕e ihe-otiti ekpenta di nime ya, ma ọ bu uwe aji-anu, ma-ọbu uwe flax;

48 ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie; nke flax, ma-ọbu nke aji-anu; ma ọ bu n’akpukpọ, ma-ọbu n’ihe ije-ozi ọ bula eji akpukpọ me:

49 ọ buru kwa na ihe-otiti ahu acha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara n’uwe, ma-ọbu n’akpukpọ, ma-ọbu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n’ihe akpukpọ ọ bula; ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, agēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya:

50 onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu, mechibido kwa ihe nwere ihe-otiti nime ulo ubọchi asa:

51 ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu n’ubọchi nke-asa: mb͕e ihe-otiti ahu baworo aba n’uwe, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n’akpukpọ, nke ihe ọ bula agēji akpukpọ me iji je ozi; ekpenta nke jọb͕uru onwe-ya ka ihe-otiti ahu bu; ihe ruru árú ka ọ bu.

52 O gēsure kwa uwe ahu ọku, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, n’aji-anu ma-ọbu na flax, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke ihe-otiti ahu di nime ya: n’ihi na ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu; n’ọku ka agēsure ya.

53 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n’uwe ahu, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n’ihe akpukpọ ọ bula;

54 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha sua ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya, o gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ:

55 onye-nchu-àjà gāhu kwa, mb͕e asuchasiri ihe-otiti ahu: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anweghi iru-ya, ọ buru kwa na ihe-otiti ahu abaghi aba, ihe ruru árú ka ọ bu; n’ọku ka i gēsure ya: ekpenta ka ọ bu, ma ọ bu n’isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n’egedege-iru-ya kwọchara akwọcha.

56 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi mb͕e asuchasiri ya, ọ gādọwapu kwa ya nime uwe ahu, ma-ọbu nime akpukpọ ahu, ma-ọbu nime nke akpara ogologo, ma-ọbu nime nke akpara uhie.

57 Ma ọ buru na anāhu ya n’uwe ub͕u a, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu na nke ihe akpukpọ ọ bula, ihe nāb͕awaputa ka ọ bu: n’ọku ka i gēsure ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya.

58 Uwe ahu kwa, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke i gāsu, ọ buru na ihe-otiti ahu esiwo nime ha wezuga onwe-ya, agāsu kwa ya nke ub͕ò abua, ọ gādi kwa ọcha.

59 Nka bu iwu nke ihe-otiti ekpenta n’uwe aji-anu ma-ọbu nke flax, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, isi na ọ di ọcha, ma-ọbu isi na ọ ruru árú.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 14

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Nka gābu iwu onye-ekpenta n’ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha: na agēme ya ka ọ biakute onye-nchu-àjà:

3 onye-nchu-àjà gāpu kwa je n’azu ọmuma-ulo-ikwū: onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na emewo ka ihe-otiti ekpenta si n’aru onye-ekpenta ahu la;

4 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ewere nnunu abua di ndu di kwa ọcha, na osisi cedar, na ogho uhie, na hyssop, bayere onye anēme ka ọ di ọcha:

5 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka eb͕ue otù nime nnunu ahu nime ihe ájá n’elu miri nērù erù:

6 nnunu ahu nke di ndu, o gēwere ya, na osisi cedar ahu, na ogho uhie ahu, na hyssop ahu, sue ha na nnunu ahu di ndu n’ọbara nnunu ahu eb͕uru n’elu miri nērù erù:

7 ọ gēfesa kwa ya ub͕ò asa n’aru onye-ahu anēme ka ọ di ọcha n’ekpenta, ọ gāsi kwa na ọ di ọcha, o gēzilaga kwa nnunu ahu di ndu nime ọhia sara iru.

8 Onye ahu anēme ka ọ di ọcha gāsu kwa uwe-ya nile, kọpu kwa aji-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gādi kwa ọcha: emesi kwa ọ gābata nime ọmuma-ulo-ikwū, ma ọ gānọdu n’ezí ulo-ikwū-ya ubọchi asa.

9 O gēru kwa n’ubọchi nke-asa, na ọ gākọpu aji-ya nile, bú agiri-isi-ya, na afu-ọnu-ya, na iku-anya-ya, ọbuná aji-ya nile ka ọ gākọpu: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, ọ gādi kwa ọcha.

10 Ma n’ubọchi nke-asatọ ọ gēwere umu-ebulu abua zuru okè, na otù nwa-aturu zuru okè nke bu nne, nke b͕ara otù arọ, na uzọ atọ n’uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, na otù log nke manu.

11 Onye-nchu-àjà nke nēme ya ka ọ di ọcha gēguzo kwa nwoke ahu anēme ka ọ di ọcha, na ihe ahu di iche iche, n’iru Jehova, n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu:

12 onye-nchu-àjà gēwere kwa otù nime umu-ebulu ahu, weta ya nso ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ya na log nke manu ahu, ọ gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n’iru Jehova:

13 o gēb͕u kwa nwa-ebulu ahu n’ebe o nēb͕u àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku, n’ebe nke ebe nsọ ahu; n’ihi na, dika àjà-nmehie, àjà-ikpe-ọmuma bu ihe onye-nchu-àjà nwere: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu:

14 onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-àjà gētiye kwa ya n’ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n’isi-aka nke aka-nri-ya, na n’isi-ukwu nke ukwu aka nri ya:

15 onye-nchu-àjà gēweta kwa ufọdu nime log nke manu ahu, wusi ya n’ọbu-aka-ekpe nke onye-nchu-àjà ahu:

16 onye-nchu-àjà gēdeye kwa nkpisi-aka-nri-ya nime manu nke di n’ọbu-aka-ekpe-ya, ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime manu ahu ub͕ò asa n’iru Jehova:

17 ufọdu nime manu nke fọduru n’ọbu-aka-ya ka onye-nchu-àjà gētiye kwa n’ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye ahu anēme ka ọ di ọcha, na n’isi-aka nke aka-nri-ya, na n’isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n’elu ọbara àjà-ikpe-ọmuma:

18 ma manu nke fọduru n’ọbu-aka nke onye-nchu-àjà, o gētiye ya n’isi onye anēme ka ọ di ọcha: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n’iru Jehova.

19 Onye-nchu-àjà gēme kwa àjà-nmehie, kpuchiere ya nmehie-ya, bú onye anēme ka o si n’ọrurú-ya di ọcha; emesia o gēb͕u kwa àjà-nsure-ọku:

20 onye-nchu-àjà gēsure kwa àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n’ebe-ichu-aja: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, ọ gādi kwa ọcha.

21 Ma ọ buru na ob͕eye ka ọ bu, nke aka-ya nērughi kwa ya, o gēwere kwa otù nwa-ebulu ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma ibu àjà-ofufè, ikpuchiri ya nmehie-ya, na otù uzọ n’uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara manu ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, na otù log nke manu;

22 na nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, nke aka-ya ruru; otù gābu kwa àjà-nmehie, ibe-ya gābu àjà-nsure-ọku.

23 Ọ gēweta-kwa-ra ha onye-nchu-aja n’ubọchi nke-asatọ ime ka ọ di ọcha, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, n’iru Jehova.

24 Onye-nchu-aja gēwere kwa nwa-aturu ahu nke àjà-ikpe-ọmuma, na log manu ahu, onye-nchu-aja gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n’iru Jehova:

25 o gēb͕u kwa nwa-aturu àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu, tiye ya n’ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n’isi-aka nke aka-nri-ya, na n’isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya:

26 ọ bu kwa ufọdu nime manu ahu ka onye-nchu-aja gāwusi n’ọbu-aka-ekpe onye-nchu-aja ahu:

27 onye-nchu-aja gēwere kwa nkpisi-aka-nri-ya fesa ufọdu nime manu nke di n’ọbu-aka-ekpe-ya ub͕ò asa n’iru Jehova:

28 onye-nchu-aja gētiye kwa ufọdu nime manu nke di n’ọbu-aka-ya n’ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n’isi-aka nke aka-nri-ya, na n’isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n’elu ebe ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu:

29 ma nke fọduru nime manu nke di n’ọbu-aka onye-nchu-aja, o gētiye ya n’elu isi onye anēme ka ọ di ọcha, ikpuchiri ya nmehie-ya n’iru Jehova.

30 Ọ gāchu kwa otù nime nduru ahu n’àjà, ma-ọbu nime umu-kpalakwukwu ahu, nime ihe aka-ya ruru;

31 ọbuná ihe aka-ya ruru, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n’elu onyinye-inata-iru-ọma: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, bú onye anēme ka ọ di ọcha n’iru Jehova.

32 Nka bu iwu nke onye ahu ihe-otiti ekpenta di n’aru ya, onye aka-ya nērughi n’ihe ime ya ka ọ di ọcha.

33 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

34 Mb͕e unu gābata n’ala Kenean, nke Mu onwem nēnye unu ka ọ buru ihe-onwunwe, M’we tiye ihe-otiti ekpenta n’ulo ọ bula nke ala ahu, bú ihe-onwunwe-unu;

35 onye nwe ulo ahu gābia kwa, gosi onye-nchu-àjà, si, Emewom ka m’hu ihe dika ihe-otiti n’ulo:

36 onye-nchu-aja gēnye kwa iwu ka akwapu ihe di n’ulo ahu, tutu onye-nchu-àjà abà nime ihu ihe-otiti ahu, ka aghara ime ka ihe nile nke di n’ulo ru árú: emesia onye-nchu-àjà gābà kwa ihu ulo ahu:

37 ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu di na mb͕idi ulo, nēnwe okokoro nke nācha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara, ọ buru kwa na ha di ala kari mb͕idi ahu, n’ile anya;

38 onye-nchu-àjà gēsi kwa n’ulo ahu pua rue ọnu-uzọ ulo ahu, mechi kwa ulo ahu ubọchi asa:

39 onye-nchu-àjà gābiaghachi n’ubọchi nke-asa, le kwa anya: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu aba aba na mb͕idi ulo;

40 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha dọpu nkume nile nke ihe-otiti ahu di nime ha, tubà ha n’azu obodo, n’ebe ruru árú:

41 ọ gēme kwa ka akpucha ulo ahu nime buruburu, ha gāwusi kwa ájá nke ha kpuchapuru n’azu obodo, n’ebe ruru árú:

42 ha gēweta kwa nkume ọzọ, me ka ha ba n’ọnọdu nkume ahu: ájá ọzọ ka ọ gēwere kwa, te ulo ahu.

43 Ma ọ buru na ihe-otiti ahu alaghachi, b͕awaputa n’ulo ahu, mb͕e ọ dọpusiri nkume ahu, mb͕e ọ kpuchasi-kwa-ra ulo ahu, mb͕e etesi-kwa-ra ya;

44 onye-nchu-àjà gābata kwa, le anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu abawo aba n’ulo, ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu nke di n’ulo: ihe ruru árú ka ọ bu

45 Ọ gākwatu kwa ulo ahu, bú nkume-ya nile, na osisi-ya nile, na ájá nile nke ulo ahu: o gēbupu kwa ha je n’azu obodo, n’ebe ruru árú.

46 Ọzọ, onye nābà n’ulo ahu ubọchi nile o mechiri ya gāru árú rue anyasi.

47 Onye nēdina kwa n’ulo ahu gāsu uwe-ya nile; ọzọ, onye nēri ihe n’ulo ahu gāsu uwe-ya nile.

48 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà abata nime, le anya, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n’ulo ahu, mb͕e etesiri ulo ahu; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ulo ahu di ọcha, n’ihi na emewo ka ihe-otiti ahu la.

49 Ọ gēwere kwa nnunu abua, na osisi cedar, na ogho uhie, na hyssop, iwepu nmehie n’ulo ahu:

50 ọ gēb͕u kwa otù nime nnunu ahu n’ihe ájá n’elu miri nērù erù:

51 ọ gēwere kwa osisi cedar ahu, na hyssop ahu, na ogho uhie ahu, na nnunu ahu di ndu, sue ha nime ọbara nnunu ahu eb͕uru eb͕u na nime miri ahu nērù erù, fesa kwa ulo ahu ub͕ò asa:

52 Ọ gēwepu kwa nmehie n’ulo ahu site n’ọbara nnunu ahu, site kwa na miri ahu nērù erù, site kwa na nnunu ahu di ndu, site kwa n’osisi cedar ahu, site kwa na hyssop ahu, site kwa n’ogho uhie ahu:

53 ma ọ gēzilaga nnunu ahu di ndu n’azu obodo n’ọhia sara iru: ọ gēkpuchi-kwa-ra ulo ahu nmehie-ya: ọ gādi kwa ọcha.

54 Nka bu iwu diri ihe-otiti ekpenta ọ bula, di-kwa-ra ọria-isi;

55 di-kwa-ra ekpenta uwe, di-kwa-ra ulo;

56 di-kwa-ra ihe-otutó, di-kwa-ra ọnyá, di-kwa-ra ntupọ nēke uke:

57 izi ihe n’ubochi nke iru-árú-ya na n’ubọchi nke idi-ọcha-ya: nka bu iwu ekpenta.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 15

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

2 Gwanu umu Israel okwu, si ha, Nwoke ọ bula, mb͕e orùrù di sitere n’anu-aru-ya, n’ihi orùrù-ya onye ruru árú ka ọ bu.

3 Nka gābu kwa ọrurú n’orùrù-ya: ma ọ bu na anu-aru-ya nērù n’orùrù-ya, ma ọ bu na eb͕ochiwo anu-aru-ya n’orùrù-ya, orurú-ya ka ọ bu.

4 Ihe-ndina ọ bula nke onye nwere orùrù ahu nēdinakwasi gāru árú: ihe ọ bula kwa nke ọ nānọkwasi gāru árú.

5 Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

6 Onye nānọkwasi n’ihe nke onye nwere orùrù nānọkwasi gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

7 Onye nēmetu anu-aru nke onye ahu nwere orùrù gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

8 Ọzọ, mb͕e onye nwere orùrù gābusa onye di ọcha ọnu-miri: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

9 Ihe ọ bula eji anọkwasi anumanu nke onye nwere orùrù nānọkwasi gāru kwa árú.

10 Onye ọ bula nke nēmetu ihe ọ bula di n’okpuru ya aru gāru árú rue anyasi: onye nēbu kwa ha gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

11 Onye ọ bula nke onye nwere orùrù nēmetu aka, mb͕e ọ nāṅachaghi aka-ya abua na miri, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

12 Ihe ájá kwa, nke onye nwere orùrù nēmetu aru, agētiwa ya: ihe osisi ọ bula kwa, agāṅacha ya na miri.

13 Ma mb͕e emeworo onye nwere orùrù ka ọ di ọcha site n’orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa ime ka ọ di ọcha, ọ gāsu kwa uwe-ya nile: ọ gāsa kwa anu-aru-ya nime miri nērù erù, ọ gādi kwa ọcha.

14 Ma n’ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n’onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, bia n’iru Jehova rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, nye ha onye-nchu-àjà:

15 onye-nchu-àjà gēme kwa ha, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n’iru Jehova n’ihi orùrù-ya.

16 Nwoke ọ bula, mb͕e ure-ya gēsi n’aru-ya pua, ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya nile, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

17 Uwe ọ bula, ma-ọbu akpukpọ ọ bula, nke ure dikwasi ya, agāsu ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

18 Nwayi kwa, onye nwoke nēdinayere, nke ọ rara aru n’aru-ya, ha abua gēwere miri sa aru-ha, ha gāru kwa árú rue anyasi.

19 Ọzọ, nwayi, mb͕e ọ nwere orùrù, ma orùrù-ya nke di n’anu-aru-ya bu ọbara ubọchi asa ka ọ gānọ n’idi-na-nsọ-ya: onye ọ bula nke nēmetu ya aru gāru kwa árú rue anyasi.

20 Ihe ọ bula nke o nēdinakwasi n’idi-na-nsọ-ya gāru kwa árú: ihe ọ bula kwa nke ọ nānọkwasi gāru árú.

21 Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

22 Onye ọ bula nke nēmetu ihe ọ bula ọ nānọkwasi aru gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

23 Ọ buru kwa na ọ bu n’ihe-ndina ka ọ dikwasi, ma-ọbu n’ihe nke ya onwe-ya nānọkwasi, mb͕e ọ nēmetu ya aru, ọ gāru árú rue anyasi.

24 Ọ buru kwa na ya nwoke edina ma-ọli, idi-na-nsọ-ya adikwasi n’aru nwoke ahu, ọ gāru árú ubọchi asa; ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi gāru kwa árú.

25 Nwayi ọ bula kwa, mbe o nwere orùrù-ọbara nēru ọtutu ubọchi, ma ọ dighi na mb͕e idi-na-nsọ-ya, ma-ọbu mb͕e ọ nwere orùrù gabiga mb͕e idi-na-nsọ-ya; ubọchi nile nke orúrú nke ọrurú-ya ọ gādi ka ubọchi idi-na-nsọ-ya; onye ruru árú ka ọ bu.

26 Ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi ubọchi nile nke orùrù-ya gādi ya ka ihe-ndina idi-na-nsọ-ya: ihe ọ bula nke ọ nānọkwasi gāru kwa árú, dika ọrurú idi-na-nsọ-ya.

27 Onye ọ bula nke nēmetu ha aru gāru kwa árú, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

28 Ma ọ buru na emewo ka nwayi ahu di ọcha site n’orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa, emesi kwa ọ gādi ọcha.

29 N’ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n’onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, wetara ha onye-nchu-àjà, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

30 Onye-nchu-àjà gēme kwa otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n’iru Jehova n’ihi orùrù nke ọrurú-ya.

31 Unu gēkewapu kwa umu Israel n’ọrurú-ha; ka ha we ghara inwu n’ọrurú-ha, mb͕e ha meruru ebe-obibim nke di n’etiti ha.

32 Nka bu iwu nke onye nwere orùrù, na nke onye ure-ya si n’aru-ya pua, imeru ya nime ya;

33 na nke nwayi nke aru nādighi ya ike n’idi-na-nsọ-ya, na nke onye nwere orùrù, bú orùrù nke nwoke ma-ọbu nke nwayi, na nke nwoke nke ya na nwayi ruru árú nēdina.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 16

1 Jehova we gwa Moses okwu, mb͕e umu-ndikom abua nke Eron nwusiri, mb͕e ha biaruru nso n’iru Jehova, we nwua;

2 Jehova we si Moses, Gwa Eron, bú nwa-nne-gi, okwu, ka ọ ghara ibata mb͕e nile n’ebe nsọ a nime ákwà-nb͕ochi, n’iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n’elu ib͕e ahu; ka ọ we ghara inwu: n’ihi na nime igwe-oji ka agāhum n’elu ebe-nkpuchi-nmehie.

3 Nka ka Eron gēwere bata n’ebe nsọ a: ọ gēwere nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nmehie, na ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku.

4 Uwe-ime di nsọ nke ákwà ọcha ka o gēyiri, uwe-ukwu nke ákwà ọcha gādikwasi kwa n’anu-aru-ya, agēwere kwa ihe ike n’úkwù nke ákwà ọcha ke ya, akwa nkechi nke ákwà ọcha ka agēkpukwasi kwa ya: uwe nsọ ka ha bu; ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya, we yiri ha.

5 N’aka nzukọ umu Israel ka ọ gānara kwa nkpi abua ka ha buru àjà-nmehie, na otù ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku.

6 Eron gēweta kwa nso oké-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, ọ gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha.

7 Ọ gēwere kwa nkpi abua ahu, guzo ha n’iru Jehova n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

8 Eron gēfe kwa nzà n’elu nkpi abua ahu; otù nzà diri Jehova, otù nzà di-kwa-ra ewu-ọpupu.

9 Eron gēweta kwa nso nkpi ahu nke nzà nke diri Jehova mara, ọ gēme kwa ya ka ọ buru àjà-nmehie.

10 Ma nkpi ahu, nke nzà nke diri ewu-ọpupu mara, agēguzo ya na ndu n’iru Jehova, ikpuchi nmehie n’elu ya, izilaga ya n’ọzara ka ọ buru ewu-ọpupu.

11 Eron gēweta kwa nso oke-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, o gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha, o gēb͕u kwa oke-ehi àjà-nmehie ahu nke diri ya onwe-ya:

12 ọ gēwere kwa ihe-igu-ọku juputara n’icheku-ọku site n’elu ebe-ichu-àjà, site n’iru Jehova, na nju aka-ya abua nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke eji uda utọ di iche iche me, bú nke esupiara esupia, ọ gēwebata ya nime ákwà-nb͕ochi:

13 ọ gētiye kwa ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ n’elu ọku n’iru Jehova, ka anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku ahu nke nēsi ísì utọ we kpuchie ebe-nkpuchi-nmehie nke di n’elu ihe-àmà ahu, ka ọ we ghara inwu:

14 ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, were nkpisi-aka-ya fesa ya n’iru ebe-nkpuchi-nmehie chere iru n’Iru-anyanwu; ọ bu kwa n’iru ebe-nkpuchi-nmehie ahu ka ọ gēwere nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa.

15 Ọ gēb͕u kwa nkpi àjà-nmehie ahu, nke diri ndim, webata ọbara-ya nime ákwà-nb͕ochi, were ọbara-ya me dika o were ọbara oke-ehi ahu me, fesa ya n’elu ebe-nkpuchi-nmehie, na n’iru ebe-nkpuchi-nmehie:

16 ọ gēkpuchi-kwa-ra ebe nsọ a nmehie-ya, n’ihi ọrurú nile nke umu Israel, na n’ihi njehie nile ha, bú nmehie-ha nile: otú a ka ọ gēme-kwa-ra ulo-ikwū nzute, nke nēbiyere ha n’etiti ọrurú nile ha.

17 Ọ dighi kwa madu ọ bula gānọ n’ulo-ikwū nzute mb͕e ọ nābà ikpuchi nmehie n’ebe nsọ a, rue mb͕e ọ putara, kpuchisi-kwa-ra onwe-ya, kpuchisi-kwa-ra ulo-ya, kpuchisi-kwa-ra nkpọkọta nile nke Israel, nmehie-ha.

18 Ọ gāpu kwa je n’ebe-ichu-àjà nke di n’iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; were kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, na ufọdu nime ọbara nkpi ahu, tiye ya n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà buruburu.

19 Ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu n’elu ya ub͕ò asa, me ya ka ọ di ọcha, do kwa ya nsọ site n’ọrurú nile nke umu Israel.

20 Mb͕e o kpuchibiri nmehie ebe nsọ a, na nke ulo-ikwū nzute, na nke ebe-ichu-àjà, ọ gēweta nso nkpi ahu di ndu:

21 Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n’isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n’elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie-ha nile; o gētiye kwa ha n’elu isi nkpi ahu, zilaga ya n’ọzara site n’aka nwoke jikere ejikere:

22 nkpi ahu gēbu kwa n’aru ya ajọ omume-ha nile rue ala nkewapu: o gēzilaga kwa nkpi ahu n’ọzara.

23 Eron gābata kwa n’ulo-ikwū nzute, yipu uwe ákwà ọcha ahu nile, nke o yiri mb͕e ọ batara n’ebe nsọ a, ọ gāwusa ha n’ebe ahu:

24 ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya n’ebe di nsọ, o gēyiri kwa uwe-ya nile, puta, me àjà-nsure-ọku-ya na àjà-nsure-ọku nke ndim, kpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ndim, nmehie-ha.

25 Abuba àjà-nmehie ahu, o gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-àjà.

26 Onye nēzilaga nkpi ka ọ buru ewu-ọpupu gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n’ọmuma-ulo-ikwū.

27 Oke-ehi àjà-nmehie ahu kwa, na nkpi àjà-nmehie ahu, nke ewebatara ọbara-ha ikpuchi nmehie n’ebe nsọ a, agēbupu ha je n’azu ọmuma-ulo-ikwū; ha gēsure kwa akpukpọ-ha na anu-ha na nsi-ha nime ọku.

28 Onye nēsure ha ọku gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n’ọmuma-ulo-ikwū.

29 Ọ gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi: n’ọnwa nke-asa, n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, unu gēweda nkpuru-obi-unu n’ala, ghara kwa ije ozi ọ bula, ma ọ bu onye amuru n’ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n’etiti unu:

30 n’ihi na n’ubọchi a ka agēkpuchiri unu nmehie-unu, ime ka unu di ọcha; site na nmehie nile unu ka unu gādi ọcha n’iru Jehova.

31 Ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ buru unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n’ala: ọ bu ukpuru ebighi-ebi.

32 Onye-nchu-àjà ahu, nke agēte manu, nke agēmeju kwa aka-ya ibu onye-nchu-àjà n’ọnọdu nna-ya, ọ gēkpuchi nmehie, yiri kwa uwe ákwà ọcha ahu, bú uwe nsọ ahu:

33 o gēkpuchi kwa nmehie nke ebe nsọ a di nsọ, nmehie ulo-ikwū nzute na nke ebe-ichu-aja ka ọ gēkpuchi kwa: ọ gēkpuchi-kwa-ra ndi-nchu-àjà, kpuchi-kwa-ra ndi nile nke nkpọkọta a, nmehie-ha.

34 Nka gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi, ikpuchiri umu Israel nmehie nile ha otù ub͕ò n’arọ. Ọ we me dika Jehova nyere Moses iwu.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 17

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu, si ha; Nka bu ihe nke Jehova nyeworo n’iwu, si,

3 Nwoke ọ bula nke ulo Israel, nke nēb͕u ehi, ma-ọbu nwa-aturu, ma-ọbu ewu, n’omuma-ulo-ikwū, ma ọbu nke nēb͕u ya n’azu ọmuma-ulo-ikwū,

4 ma ọ wetaghi ya n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, iweta ya nso ka ọ buru onyinye iji biaru nso Jehova n’iru ebe-obibi Jehova: ọbara ka agāguru nwoke ahu; ọbara ka ọ wusiworo; agēbipu kwa nwoke ahu n’etiti ndi-ya:

5 ka umu Israel we weta àjà nile ha, nke ha onwe-ha nāchu n’ọhia sara iru, ọbuná ka ha we wetara ha Jehova, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, were ha biakute onye-nchu-àjà, chua ha ka ha buru ihe àjà nke àjà udo anāchuru Jehova.

6 Onye-nchu-àjà gāwusa ọbara-ha n’elu ebe-ichu-àjà nke Jehova n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

7 Ha agaghi-achu-kwa-ra nkpi àjà-ha ọzọ, nke ha onwe-ha so nākwa iko. Ukpuru ebighi-ebi ka nka gāburu ha rue ọb͕ọ-ha nile.

8 I gāsi kwa ha, Nwoke ọ bula nke sitere n’ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n’etiti ha, nke nēsure àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ,

9 ma ọ wetaghi ya n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute imere ya Jehova, agēbipu kwa nwoke ahu n’etiti umu-nna-ya.

10 Ọzọ, nwoke ọ bula nke sitere n’ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n’etiti ha, nke nēri ọbara ọ bula; M’gēche kwa irum megide madu ahu nke nēri ọbara, M’gēbipu kwa ya n’etiti ndi-ya.

11 N’ihi na ndu nke anu-aru, n’ọbara ka ọ di: Mu onwem enyewo kwa unu ya n’elu ebe-ichu-àjà ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie-ha n’ihi na ọbara ka ọ bu nke nēkpuchi nmehie nime nkpuru-obi.

12 N’ihi nka ka M’siri umu Israel, Ọ dighi madu ọ bula n’etiti unu gēri ọbara, ọbìa kwa, nke nọ dika ọbìa n’etiti unu, ọ gaghi-eri ọbara.

13 Ọzọ nwoke ọ bula nke sitere n’umu Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n’etiti ha, nke nāchu ntá ihe, ma ọ bu anu-ọhia ma-ọbu anu-ufe, nke anēri eri; ọ gāwusi kwa ọbara-ya, were ájá kpuchi ya.

14 N’ihi na ọ bu ndu nke anu-aru ọ bula; ọbara-ya, ya na ndu-ya bu otù: M’we si umu Israel, Unu erila ọbara anu-aru ọ bula: n’ihi na ndu nke anu-aru ọ bula, ọbara-ya ka ọ bu onye ọ bula nke nēri ya, agēbipu ya.

15 Madu ọ bula nke nēri ihe nwuru onye-ya, ma-ọbu ihe anu-ọhia dọb͕uru, n’etiti ndi amuru n’ala ma-ọbu n’etiti ndi-ọbìa, ọ gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ọ we di ọcha.

16 Ma ọ buru na ọ sughi ha, ọ buru kwa na ọ saghi anu-aru-ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 18

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

3 Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n’ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n’ukpuru nile ha.

4 Ikpém nile ka unu gēme, ọ bu kwa ukpurum nile ka unu gēdebe, ijeghari nime ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

5 Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile: nke madu gēme, di ndu nime ha: Mu onwem bu Jehova.

6 Nwoke ọ bula abiarula nso onye-aru-ya ọ bula, ikpughe ọtọ-ya: Mu onwem bu Jehova.

7 Ekpughela ọtọ nna-gi, bú ọtọ nne-gi: nne-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya.

8 Ekpughela ọtọ nwunye nna-gi: ọtọ nna-gi ka ọ bu.

9 Ọtọ nwa-nne-gi nwayi, bú nwa nke nna-gi ma-ọbu nwa nke nne-gi, nke amuru n’ulo, ma-ọbu nke amuru n’èzí, ekpughela ọtọ-ha.

10 Ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwoke, ma-ọbu ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwayi, ekpughela ọtọ-ha: n’ihi na ọtọ-gi ka ọtọ-ha bu.

11 Ọtọ nwa-nwayi nke nwunye nna-gi, nke nna-gi muru, nwa-nne-gi nwayi ka ọ bu, ekpughela ọtọ-ya.

12 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nna-gi: onye-aru nna-gi ka ọ bu.

13 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nne-gi: n’ihi na onye-aru nne-gi ka ọ bu.

14 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-gi, abiarula nwunye-ya nso: nwunye nwa-nne nna-gi ka ọ bu.

15 Ekpughela ọtọ nwunye nwa-gi: nwunye nwa-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya.

16 Ekpughela ọtọ nwunye nwa-nne-gi: ọtọ nwa-nne-gi ka ọ bu.

17 Ekpughela ọtọ nwanyi na nwa ya nwanyi; ekurula nwa-nwanyi nke nwa-ya nwoke, ma-ọbu nwa-nwayi nke nwa ya nwanyi, ikpughe ọtọ-ya; ndi-aru ka ha bu: nzube ọjọ ka ọ bu.

18 Ekuru-kwa-la nwayi tiyere nwa-nne-ya nwayi, ikpab͕u ya, ikpughe ọtọ-ya, tiyere ya na ndu-ya.

19 Abiarula nso nwayi ikpughe ọtọ-ya n’idi-na-nsọ nke ọrurú-ya.

20 Gi na nwunye madu-ibe-gi edinala ka i ra aru n’aru-ya, iwere ya meru onwe-gi.

21 Enye-kwa-la onye ọ bula nime nkpuru-gi ime ka ha gabiga rue Molek, eme-kwa-la ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.

22 Gi na nwoke edinala dika nwoke na nwayi nēdina ihe-árú ka ọ bu.

23 Gi na anumanu ọ bula edina-kwa-la ka i ra aru n’aru-ya, iwere ya meru onwe-gi: nwayi agaghi-eguzo kwa n’iru anumanu iso ya dina; ngwakọta ọjọ ka ọ bu.

24 Unu ewerela ihe ndia nile meru onwe-unu: n’ihi na ewere ihe ndia nile me ka mb͕a nile rua árú, bú ndi Mu onwem nāchupu n’iru unu:

25 ala ahu ru-kwa-ra árú: M’nēwere kwa ajọ emume-ya leta ya, ala ahu nāb͕ọputa kwa ndi bi nime ya.

26 Unu onwe-unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, ghara kwa ime ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile; ma ọ bu onye amuru n’ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n’etiti unu:

27 (n’ihi na ihe-áru ndia nile ka ndikom nke ala ahu meworo, ndi nọ n’iru unu, ala ahu ru-kwa-ra árú;)

28 ka ala ahu we ghara ib͕ọputa unu mb͕e unu nēmeru ya, dika ọ b͕ọputara mba ahu nke di n’iru unu.

29 N’ihi na onye ọ bula nke nēme ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile, agēbipu nkpuru-obi nile nēme ha n’etiti ndi-ha.

30 Unu gēdebe kwa ihe-ndebem, ka unu we ghara ime ihe ọ bula nime ukpuru ihe-árú ndia, nke anēmeri n’iru unu, ka unu we ghara kwa iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 19

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si ha, Nsọ ka unu gādi: n’ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, Chineke-unu, di.

3 Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

4 Unu echela ihe-efu ọ bula iru, unu eme-kwa-lara onwe-unu chi ọ bula awuru awu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

5 Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà nké àjà-udo, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.

6 N’ubọchi unu churu ya ka agēri ya, ya na echi-ya: ma nke fọduru rue ubọchi nke-atọ, n’ọku ka agēsure ya.

7 Ma ọ buru na erie ya ma-ọli n’ubọchi nke-atọ, ihe-árú ka ọ bu; ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ:

8 ma onye nēri ya gēbu ajọ omume-ya, n’ihi na ihe nsọ nke Jehova ka o meworo ka ọ ghara idi nsọ: aga ebipu kwa nkpuru-obi ahu n’etiti umu-nna-ya.

9 Ma mb͕e unu nēwe ihe-ubi nke ala-unu, ewesila ihe di n’akuku ubi-gi, achikọta-kwa-la ihe-nchikọta nke owuwe-ihe-ubi-gi fọduru

10 Atutukọ-kwa-la nkpuru ubi-vine-gi fọduru, achikota-kwa-la nkpuru dara ada n’ubi-vine-gi; ob͕eye na ọbìa ka i gārapuru ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

11 Unu ezula ori; unu aghọ-kwa-la aghughọ, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha, otù n’ebe ibe-ya nọ.

12 Unu ewe-kwa-la aham ṅu iyi n’okwu-ugha, we me ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.

13 Emeb͕ula madu-ibe-gi, anapu-kwa-la ya ihe n’ike: ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu agaghi-adigide n’aka-gi ogologo abali nile rue ututu.

14 Akọchala onye nti chiri, etiye-kwa-la ihe-isu-ngọngọ n’iru onye-ìsì, ma tua egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.

15 Unu emela ajọ omume n’ikpé: ahụla onye nēnweghi ike ikpemara iru ọma, asọpuru-kwa-la iru nke onye uku: n’ezi omume ka i gēkpe madu-ibe-gi ikpe.

16 Ejegharila n’etiti umu-nna-gi dika onye nāb͕a àmà ọjọ: eguzola imegide ọbara madu-ibe-gi: Mu onwem bu Jehova.

17 Akpọla nwa-nne-gi asi n’obi-gi: i ghaghi ibara madu-ibe-gi nba, ghara ibu nmehie bayere ya.

18 Abọla ọ́bọ̀, edebe-kwa-la iwe megide umu ndi-gi, ma hu madu-ibe-gi n’anya dika onwe-gi: Mu onwem bu Jehova.

19 Unu gēdebe ukpurum nile. Emela ka anu-ulo-gi di iche iche nāb͕a onwe-ha: aghala uzọ nkpuru abua n’ubi-gi: uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta agaghi-abia n’aru-gi.

20 Ma mb͕e nwoke soro nwayi dina ka ọ ra aru n’aru-ya, ma nwayi ahu bu nwayi nēje ozi, nke nwoke kwere ilu, nke anāb͕aputaghi ma-ọli, nke anēmeghi kwa ka ọ nwere onwe-ya: nchọputa okwu ahu gādi; agaghi-eme ka ha nwua, n’ihi na emeghi ka nwayi ahu nwere onwe-ya.

21 O gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, bú ebulu ibu àjà-ikpe-ọmuma.

22 Onye-nchu-àjà gēwere kwa ebulu àjà-ikpe-ọmuma ahu kpuchiri ya nmehie-ya n’iru Jehova bayere nmehie-ya nke o mehieworo: agāb͕aghara kwa ya nmehie-ya nke o mehieworo.

23 Ma mb͕e unu gābà n’ala ahu, mb͕e unu gākuwori osisi nile ọ bula ibu ihe-oriri, unu gāgu kwa nkpuru-ya n’ebighi-úgwù-ya: arọ atọ ka ọ gāburu unu ihe anēbighi úgwù; agaghi-eri ya.

24 Ma n’arọ nke-anọ nkpuru-ya nile gādi nsọ, otuto anēto Jehova.

25 Ma n’arọ nke-ise unu gēri nkpuru-ya, ka ọ we mikwasiri unu ihe ọmume-ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

26 Unu erila ihe ọ bula ya na ọbara-ya: unu ab͕ala afa, unu eji-kwa-la igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ.

27 Unu akọpula usọ isi-unu buruburu, ebibi-kwa-la usọ afu-ọnu-gi.

28 Unu eb͕ula eb͕ub͕u n’anu-aru-unu n’ihi nkpuru-obi madu, unu etiye-kwa-la ihe-odide, bú eb͕ub͕u-ọku, n’aru unu: Mu onwem bu Jehova.

29 Emela ka nwa-gi nwayi ghara idi nsọ, ime ka ọ ghọ nwayi nākwa iko; ka ala-gi we ghara ikwa iko, ka ala-gi we ghara kwa ijuputa na nzube ọjọ.

30 Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova.

31 Unu echela ndi nāju mọ ihe iru, unu eche-kwa-la ndi-dibia-afa iru; unu achọputala ha, iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

32 I gēbili ọtọ n’iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.

33 Mb͕e ọbìa gānoyere gi dika ọbìa n’ala-unu, unu emela ya ihe-ike.

34 Dika onye amuru n’ala site n’aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n’etiti unu, i gāhu kwa ya n’anya dika onwe-gi; n’ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n’ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

35 Unu emela ajọ omume-n’ikpé, ma-ọbu n’itù ihe, ma-ọbu n’isi ihe, ma-ọbu n’itù ihe di miri miri.

36 Ihe-osìsì ziri ezi, na nkume isì-ihe ziri ezi na ephah ziri ezi, na hin ziri ezi, ka unu gēnwe: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n’ala Ijipt puta.

37 Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, me kwa ha: Mu onwem bu Jehova.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 20

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 I gāsi kwa umu Israel, Nwoke ọ bula n’etiti umu Israel, ma-ọbu n’etiti ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n’Israel, nke nēnye Molek otù nwa nime nkpuru-ya: aghaghi ime ka ọ nwua: ndi ala-unu gēwere nkume tub͕ue ya.

3 Mu onwem gēche kwa irum megide nwoke ahu, bipu ya n’etiti ndi-ya; n’ihi na ufọdu nime nkpuru-ya ka o nyeworo Molek, ka o we meru ebe nsọm, na ime ka aha nsọm ghara idi nsọ.

4 Ma ọ buru na ndi ala-unu ezopu anya-ha n’aru nwoke ahu ma-ọli, mb͕e ọ nēnye Molek ufọdu nime nkpuru-ya, ha we ghara ime ka ọ nwua:

5 Mu onwem gēdo kwa irum megide nwoke ahu, megide kwa ab͕uru-ya, Mu onwem gēbipu kwa ya ndi-nile nēso ya kwa iko, bú iso Molek kwa iko, n’etiti ndi-ha.

6 Madu ahu kwa nke nēche ndi nāju mọ ihe iru, nke nēche kwa ndi-dibia-afa iru, iso ha kwa iko, M’gēdo irum megido madu ahu, bipu ya n’etiti ndi-ya.

7 Unu gēdo kwa onwe-unu nsọ we di nsọ; n’ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

8 Unu gēdebe ukpurum nile, me ha: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ.

9 N’ihi na onye ọ bula nke nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: nna-ya ma-ọbu nne-ya ka ọ kọchaworo; ọbara-ya gādikwasi ya.

10 Nwoke nke ya na nwunye nwoke ọzọ nākwa iko, bú onye ya na nwunye madu-ibe-ya nākwa iko, aghaghi ime ka ha nwua, bú nwoke ahu nākwa iko, na nwayi ahu nākwa iko.

11 Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nna-ya nēdina, ọtọ nna-ya ka o kpugheworo: aghaghi ime ka ha abua nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.

12 Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-ya nēdina, aghaghi ime ka ha abua nwua: ngwakọta ọjọ ka ha meworo; ọbara-ha gādikwasi ha.

13 Nwoke ọ bula nke ya na nwoke nēdina, dika nwoke na nwayi nēdina, ihe-árú ka ha abua meworo: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.

14 Nwoke ọ bula nke nēkuru nwayi na nne-ya, nzube ọjọ ka ọ bu: n’ọku ka agēsure ha, ya na ha; ka nzube ọjọ we ghara idi n’etiti unu.

15 Nwoke ọ bula nke ya na anumanu nēdina ka ọ ra aru n’aru-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: unu gēb͕u kwa anumanu ahu.

16 Nwayi ọ bula nke nābiaru nso anumanu ọ bula, iso ya dina, i gēb͕u nwayi ahu na anumanu ahu: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.

17 Nwoke ọ bula nke nēkuru nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-nwayi nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nne-ya, we hu ọtọ-ya, nwayi ahu we hu ọtọ-ya; ihe-ihere ka ọ bu; agēbipu kwa ha n’anya umu ndi-ha: ọtọ nwa-nne-ya nwayi ka o kpugheworo; o gēbu ajọ omume-ya.

18 Nwoke ọ bula nke ya na nwayi nke nāsọ uba nēdina, nke gēkpughe kwa ọtọ-ya; isi ọbara nwayi ahu ka ọ b͕abaworo ọtọ, nwayi ahu ekpughewo kwa isi ọbara nke ya onwe-ya: agēbipu kwa ha abua n’etiti ndi-ya.

19 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwayi nke nne-gi, ma-ọbu ọtọ nke nwa-nne-nwayi nke nna-gi: n’ihi na onye-aru-ya ka ọ b͕abaworo ọtọ: ha gēbu ajọ omume-ha.

20 Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-nne nke nna-ya nēdina, ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-ya ka o kpugheworo: nmehie-ha ka ha gēbu; ha gāb͕a aka nwa nwua.

21 Nwoke ọ bula nke nēkuru nwunye nwa-nne-ya, ihe isọ nsọ ka ọ bu: ọtọ nwa-nne-ya nwoke ka o kpugheworo; ha gāb͕a aka nwa.

22 Unu gēdebe kwa ukpurum nile, na ikpém nile, me ha: ka ọ we ghara ibọputa unu, bú ala ahu nke Mu onwem nēme ka unu ba n’ebe ahu ibi nime ya.

23 Unu ejeghari-kwa-la n’ukpuru nile nke mba ahu, nke Mu onwem nāchupu n’iru unu: n’ihi na ihe ndia nile ka ha mere, ike ha we gwusiam.

24 Ma asim unu, Unu onwe-unu gēnweta ala-ha, Mu onwem gēnyekwara unu aka inweta ya, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke kpaworo ókè n’etiti unu na ndi nile ọzọ.

25 Unu gākpa kwa ókè n’etiti anumanu di ọcha na nke ruru árú, na n’etiti anu-ufe ruru árú na nke di ọcha: unu ewe-kwa-la anumanu me onwe-unu ihe-árú, ewe-kwa-la anu-ufe, ewe-kwa-la ihe ọ bula nākpu akpu n’ala, nke M’kpaworo ókè n’etiti unu na ya, ime ka ọ rua árú.

26 Unu gābu-kwa-ram ndi nsọ: n’ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, di, akpawokwam ókè n’etiti unu na ndi nile ọzọ ka unu we buru nkem.

27 Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e mọ anāju ihe di nime ha, ma-ọbu nke bu dibia afa, aghaghi ime ka ha nwua: nkume ka ha gēwere tub͕ue ha: ọbara-ha gādikwasi ha.