Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 1

1 Jehova we kpọ Moses òkù, si n’ulo-ikwū nzute gwa ya okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e madu ọ bula n’etiti unu gēweta nso Jehova onyinye iji biaru nso, unu gēsi n’etiti anu-ulo, n’etiti ìgwè ehi na n’etiti ìgwè ewu na aturu weta nso onyinye-unu ijì biaru nso.

3 Ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu àjà-nsure-ọku sitere n’ìgwè ehi, oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso: n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ka ọ gēweta ya nso, ka o we buru ihe nātọ utọ n’iru Jehova

4 O gēbikwasi aka-ya n’isi àjà-nsure-ọku ahu; agānara kwa ya nke-ọma n’ọnọdu ya iji kpuchiri ya nmehie-ya.

5 Ọ gēb͕u kwa nwa-ehi ahu n’iru Jehova: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēweta ọbara-ya nso, wusa ọbara ahu n’ebe-ichu-àjà buruburu, bú nke di n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

6 Ọ gāb͕a kwa ehi àjà-nsure-ọku ahu akpukpọ, bọ ya n’ọbubọ-ya.

7 Umu-ndikom Eron, bú onye-nchu-àjà, gētiye ọku n’elu ebe-ichu-àjà, do nkú n’usoro n’elu ọku:

8 umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēdo anu ahu abọrọ abọ̀, na isi-ya, na abuba-ya, n’usoro n’elu nkú nke di n’elu ọku nke di n’elu ebe-ichu-àjà:

9 ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēsuresi kwa anu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’ebe-ichu-àjà, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

10 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso sitere n’ìgwè ewu na aturu, site n’aturu, ma-ọbu site n’ewu, bú nke ọ nēweta nso ibu àjà-nsure-ọku; oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso.

11 Ọ gēb͕u kwa ya n’iru Jehova n’akuku ebe-ichu-àjà chere iru n’Ugwu: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gāwusa ọbara-ya n’ebe-ichu-àjà buruburu.

12 Ọ gābọ kwa ya n’ọbubọ-ya nile, ya na isi-ya na abuba-ya: onye-nchu-àjà gēdo kwa ha n’usoro n’elu nkú nke di n’elu ọku nke di n’elu ebe-ichu-àjà:

13 ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēweta anu ahu nile nso, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’ebe-ichu-àjà; àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

14 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso Jehova bu àjà-nsure-ọku sitere n’anu-ufe, o gēsi n’etiti nduru ma-ọbu n’etiti umu-kpalakwukwu weta nso onyinye-ya iji biaru nso.

15 Onye-nchu-àjà gēweta ya nso ebe-ichu-aja, gbupu isi ya, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’ebe-ichu-àjà; agāpipu kwa ọbara-ya n’akuku ebe-ichu-àjà:

16 ọ gēwezuga kwa àkpà-nri-ya na ihe di nime ya, tufu na nso ebe-ichu-àjà n’akuku Iru-anyanwu, n’ebe ntú:

17 ọ gāb͕ọwa kwa ya na nkù-ya abua, ma ọ gaghi-ekewa ya: onye-nchu-àjà gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-aja, n’elu nkú nke di n’elu ọku: àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 2

1 Ma mb͕e madu gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú onyinye anēnye Jehova inata iru-ọma, utu ọka flour ka onyinye-ya iji biaru nso gābu; ọ gāwukwasi ya manu, tiye kwa frankincense n’elu ya:

2 ọ gēweta-kwa-ra umu-ndikom Eron ya, bú ndi-nchu-àjà: o gēsi nime ya weju nweju-aka-ya sitere n’utu ọka flour-ya, site kwa na manu-ya, tiyere frankincense nke ya nile; onye-nchu-àjà gēsure kwa ihe-ncheta-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’ebe-ichu-àjà, ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova:

3 ma nke fọduru site n’onyinye-inata-iru-ọma ahu bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọ bu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n’àjà-ọku nile anāchuru Jehova.

4 Ma mb͕e i gēweta nso onyinye iji biaru nso, bú onyinye-inata-iru-ọma esiri n’ite-ọku, ọ gābu ob͕e achicha ekoghi-eko nke utu ọka flour agwara manu, ma-ọbu mbadamba-achicha ekoghi-eko nke etere manu.

5 Ma ọ buru na onyinye-gi iji biaru nso bu onyinye-inata-iru-ọma eghere n’ite eji eghe ihe, utu ọka flour agwara manu, nke nēkoghi eko, ka ọ gābu.

6 Nyawa ya na nnyawa-ya nile, wukwasi ya manu: onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu.

7 Ma ọ buru na onyinye-gi iji biaru nso bu onyinye-inata-iru-ọma eghere n’ihe ighe ihe, utu ọka flour etiyere manu ka agēji me ya.

8 I gēweta-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma nke eji ihe ndia me: agēweta kwa ya nso onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa ya n’ebe-ichu-àjà.

9 Onye-nchu-àjà gēsi kwa n’onyinye-inata-iru-ọma ahu bulie ihe-ncheta-ya, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-àjà: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

10 Ma nke fọduru site n’onyinye-inata-iru-ọma ahu Bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọbu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n’àjà-ọku nile anāchuru Jehova.

11 Ọ dighi onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke unu gēweta nso Jehova agēji ihe nēko achicha me: n’ihi na ọ dighi ihe ọ bula nke nēko achicha, ma-ọbu manu-aṅu ọ bula, unu gēji sure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku anāchuru Jehova.

12 Dika onyinye iji biaru nso, bú nkpuru mbu, ka unu gēweta ha nso Jehova: ma n’elu ebe-ichu-àjà ka ha nāgaghi-arigo, ibu ihe ísì utọ.

13 Onyinye ọ bula iji biaru nso nke onyinye-inata-iru-ọma-gi, i gēye kwa ya nnú; eme-kwa-la ka nnú nke ọgbugba-ndu Chineke-gi ghara idi n’onyinye-inata-iru-ọma-gi: n’onyinye-gi nile iji biaru nso ka i gēweta nnú nso.

14 Ma ọ buru na i weta nso onyinye-inata-iru-ọma, bú nkpuru mbu, inye Jehova, ọka rara oko aṅara n’ọku, ọka nke ubi ọma esuru esu, ka i gēweta nso, ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma sitere na nkpuru mbu i.

15 I gētiye manu n’elu ya, tukwasi ya frankincense: onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu.

16 Onye-nchu-àjà gēsure ihe-ncheta-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ, bú ufọdu nime ọka-ya esuru esu, na ufọdu nime manu-ya, tiyere frankincense-ya nile: ọ bu àjà-ọku anāchuru Jehova.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 3

1 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ihe àjà nke àjà-udo; ọ buru na ọ bu ihe si n’ìgwè ehi puta ka ya onwe-ya nēweta nso, ma ọ bu oké ma-ọbu nwunye, n’izu-okè ka ọ gēweta ya nso n’iru Jehova.

2 O gēbikwasi aka-ya n’isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gāwusa ọbara-ya n’ebe-ichu-àjà buruburu.

3 O gēsi kwa n’ihe àjà nke àjà-udo weta nso àjà-ọku ichuru Jehova; bú abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n’elu ihe-ime,

4 na akọrọ abua, na abuba nke di n’elu ha, nke di n’akuku ákwù-ya, na mba-imeju nke di n’imeju, (n’akuku akọrọ ka ọ gēwuzuga ya).

5 Umu-ndikom Eron gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’ebe-ichu-àjà n’elu àjà-nsure-ọku, nke di n’elu nkú nke di n’elu ọku: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova.

6 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso, nke, ọ nēnye ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo ichuru Jehova, esi n’ìgwè ewu na aturu puta; oké ma-ọbu nwunye, n’izu-okè ka ọ gēweta ya nso.

7 Ọ buru na ọ bu aturu ka ya onwe-ya nēweta nso ibu onyinye-ya iji biaru nso, ọ gēweta kwa ya nso n’iru Jehova:

8 ọ gēbikwasi aka-ya n’isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n’iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n’ebe-ichu-àjà buruburu.

9 O gēsi kwa n’ihe àjà nke àjà-udo weta nso àjà-ọku ichuru Jehova: bú abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba n’izu-okè-ya, (n’ebe ọkpukpu-azu-ya di ka ọ gēwezuga ya); na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n’elu ihe-ime,

10 na akọrọ abua, na abuba nke di n’elu ha, nke di n’akuku úkwù, na mba-imeju nke di n’imeju, (n’akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya).

11 Onye-nchu-àjà gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku anāchuru Jehova.

12 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ewu, ọ gēweta kwa ya nso n’iru Jehova.

13 O gēbikwasi aka-ya n’isi-ya, b͕u kwa ya n’iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n’ebe-ichu-àjà buruburu.

14 O gēsi kwa nime ya weta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova; abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n’elu ihe-ime,

15 na akọrọ abua, na abuba nke di n’elu ha, nke di n’akuku úkwù, na mba-imeju nke di n’imeju, (n’akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya).

16 Onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku, ka ọ buru ihe ísì utọ: abuba nile bu ihe Jehova nwere.

17 Ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n’ebe-obibi-unu nile, na unu agaghi-eri abuba ọ bula ma-ọbu ọbara ọ bula.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 4

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e madu gēmehie n’amaghi-ama megide ihe ọ bula nime ihe Jehova nyere n’iwu, si, Emela ha; ọ we me otù nime ha:

3 ọ buru na onye-nchu-àjà etere manu emehie dika ikpe-ọmuma ndim si di; ọ gēweta kwa nso nwa-oke-ehi zuru okè bayere nmehie-ya, nke o mehieworo, ichuru Jehova, ka ọ buru àjà-nmehie.

4 Ọ gēme ka oke-ehi ahu biarute ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute n’iru Jehova; ọ gēbikwasi aka-ya n’isi oke-ehi ahu, b͕u kwa oké-ehi ahu n’iru Jehova.

5 Onye-nchu-àjà etere manu gēwere ufọdu nime ọbara oké-ehi, webata ya n’ulo-ikwū nzute:

6 onye-nchu-àjà ahu gēdeye nkpisi-aka-ya n’ọbara ahu, fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa n’iru Jehova, n’iru ákwà-nb͕ochi nke ebe nsọ ahu.

7 Onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me n’iru Jehova, nke di nime ulo-ikwū nzute; ọ bu kwa ọbara nile nke oke-ehi ahu ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, nke di n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

8 Ọ gēsi kwa nime ya welie abuba nile nke oke-ehi nke àjà-nmehie; bú abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n’elu ihe-ime,

9 na akọrọ abua, na abuba nke di n’elu ha, nke di n’akuku úkwù, na mba-imeju nke di n’imeju, (n’akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya),

10 dika esi n’oké-ehi nke ihe àjà nke àjà-udo eweli ya: onye-nchu-àjà gēsure kwa ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.

11 Ma akpukpọ oke-ehi ahu, na anu-ya nile, tiyere isi-ya, tiye kwa ọlu-ukwu-ya na ọlu-aka-ya, na ihe-ime-ya, na nsi-ya,

12 ọbuná oke-ehi ahu nile ka o gēbupu je n’azu ọmuma-ulo-ikwū rue ebe di ọcha, rue ikpo-ntu, sure ya n’elu nkú n’ọku: n’elu ikpo-ntu ka agēsure ya ọku.

13 Ma ọ buru na nzukọ nile nke Israel eme ihe n’amaghi-ama, ewe zopu ihe ahu n’anya nkpọkọta Israel, ọ buru kwa na ha emewo ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n’iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ha;

14 mb͕e amara nmehie nke ha mehieworo nime ya, nkpọkọta Israel ahu gēweta kwa nso nwa-oke-ehi ibu àjà-nmehie, ha gēme kwa ka ọ bia n’iru ulo-ikwū nzute.

15 Ndi-okenye nzukọ ahu gēbikwasi aka-ha n’isi oke-ehi ahu n’iru Jehova: agēb͕u kwa oke-ehi ahu n’iru Jehova.

16 Onye-nchu-aja etere manu gēwebata ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu n’ulo-ikwū nzute:

17 onye-nchu-aja gēdeye nkpisi-aka-ya nime ọbara ahu, fesa ya ub͕ò asa n’iru Jehova, n’iru akwa-nb͕ochi ahu.

18 Ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n’elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke di n’iru Jehova, nke di nime-ulo-ikwū nzute, ọ bu kwa ọbara nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, nke di n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

19 O gēsi kwa nime ya welie abuba-ya nile, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-aja.

20 Ọ gēme kwa oke-ehi ahu dika ọ mere oke-ehi nke àjà-nmehie, otú a ka ọ gēme ya: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ha nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha ya.

21 O gēbupu kwa oke-ehi ahu je n’azu ọmuma-ulo-ikwū, sure ya ọku dika o surere oke-ehi mbu: àjà-nmehie nke nkpọkọta Israel ka ọ bu.

22 Mb͕e onye-isi nēmehie, me kwa ihe n’amaghi-ama megide otù nime ihe nile Jehova nyere n’iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya;

23 ọ buru kwa na eme ka ọ mara nmehie-ya nke ọ mehieworo nime ya, ọ gēweta nkpi, bú oké zuru okè, ka ọ buru onyinye-ya iji biaru nso;

24 o gēbikwasi aka-ya n’isi nkpi ahu, b͕u kwa ya n’ebe anēb͕u anu àjà-nsure-ọku n’iru Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu.

25 Onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-nmehie na nkpisi-aka-ya, tiye ya n’elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, ọbara-ya ka ọ gāwusi kwa na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku.

26 Abuba-ya nile ka o gēsure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-aja, dika abuba ihe àjà nke àjà-udo: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.

27 Ma ọ buru na otù madu n’etiti ndi ala emehie n’amaghi-ama, n’ime ihe megide otù nime ihe Jehova nyere n’iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya;

28 ọ buru kwa na eme ka ọ mara nmehie-ya nke ọ mehieworo, ọ gēweta kwa ewu, bú nne zuru okè, bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, ka ọ buru onyinye-ya iji biaru nso.

29 Ọ gēbi-kwasi aka-ya n’isi ihe àjà-nmehie ahu, b͕u kwa ihe àjà-nmehie ahu n’ebe àjà-nsure-ọku.

30 Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, tiye ya n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà.

31 Abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika ewezugara abuba n’elu ihe àjà nke àjà-udo; onye-nchu-àjà gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-àjà, ka ọ buru ihe ísì utọ anēsurere Jehova; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.

32 Ma ọ buru na ọ weta nwa-aturu dika onyinye-ya iji biaru nso ka ọ buru àjà-nmchie, nne zuru okè ka ọ gēweta ya.

33 O gēbikwasi aka-ya n’isi ihe àjà-nmehie ahu, b͕u kwa ya ibu àjà-nmehie n’ebe ha nēb͕u ihe àjà-nsure-ọku.

34 Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu na nkpisi-aka-ya, tiye ya n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà:

35 abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika anēwezuga abuba nwa-aturu n’ihe àjà nke àjà-udo: onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-àjà, n’elu àjà-ọku nke Jehova: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya nke ọ mehieworo, agāb͕aghara kwa ya ya.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 5

1 Mb͕e madu gēmehie, site n’inu olu ọb͕ub͕a-iyi, mb͕e ya onwe-ya bu onye-àmà, ma ọ bu na ọ huwo ma-ọbu na ọ mawo, ọ buru na o gosighi ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya:

2 ma-ọbu mb͕e madu gēmetu ihe ọ bula ruru árú aru, ma ọ bu ozu anu-ọhia ruru árú, ma-ọbu ozu anu-ulo ruru árú, ma-ọbu ozu ihe nēnuputa enuputa nke ruru árú, ma ezonariri ya ya, ya onwe-ya ewe ru kwa árú, ikpe gāma kwa ya:

3 ma-ọbu mb͕e ọ gēmetu ihe ruru árú nke madu, ọbuná ihe ọ bula nke ya ruru árú nke eji meru ya, ma ezonariri ya ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya:

4 ma-ọbu mb͕e madu gāṅu iyi, nēwere eb͕ub͕ere-ọnu-ya kwu okwu efu ime ihe ọjọ, ma-ọbu ime ezi ihe, ọbuná okwu efu ọ bula madu nēkwu n’iṅu iyi, ma ezonariri ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya bayere otù nime ihe ndia:

5 o gēru kwa, mb͕e ikpe mara ya bayere otù nime ihe ndia, na o gēkwuputa ihe ahu nke ọ mehieworo nmehie bayere ya:

6 ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, bú nne nke si n’ìgwè ewu na aturu puta, nwa-aturu ma-ọbu nwa-ewu, ka ọ buru àjà-nmehie; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu.

7 Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, o gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie nke ọ mehieworo, bú nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku.

8 Ọ gāchitara ha onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēburu uzọ weta nso nke diri àjà-nmehie, ọ gātubipu isi-ya site n’olu-ya, ma ọ gaghi-ekewa ya.

9 Ọ gēfesa ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu n’elu akuku ebe-ichu-àjà; ma nke fọduru nime ọbara ka agāgbasa na ntọ-ala ebe-ichu-aja: àjà-nmehie ka ọ bu.

10 Ọ gēme nke-abua ka ọ buru àjà-nsure-ọku dika ikpé ahu si di: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu nke ọ mehieworo, agāb͕aghara kwa ya ya.

11 Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n’umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n’uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n’elu ya: n’ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.

12 Ọ gēweta-kwa-ra ya onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēweju kwa nweju-aka-ya site na ya ibu ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-àjà, n’elu àjà-ọku nke Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu.

13 Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu nke ọ mehieworo n’otù nime ihe ndia, agāb͕aghara kwa ya ya: ma nke fọduru gābu ihe onye-nchu-àjà nwere, dika onyinye-inata-iru-ọma ahu.

14 Jehova we gwa Moses okwu, si,

15 Mb͕e madu gēmekpu ihe-nmekpu, mehie n’amaghi-ama megide ihe nsọ nile nke Jehova; ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè si n’ìgwè ewu na aturu puta, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di n’ọla-ọcha shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma:

16 ma ihe nke ọ mehieworo megide ihe nsọ ahu, ọ gākwughachi ya, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n’uzọ ise n’elu ya, nye ya onye-nchu-àjà: onye-nchu-àjà gēwere ebulu àjà-ikpe-ọmuma kpuchiere ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.

17 Ma ọ buru si na madu emehie, me ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n’iwu bayere ihe anāgaghi-eme; ọ bu ezie na ọ maghi, ma ikpe mara ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya.

18 Ọ gēweta-kwa-ra onye-nchu-àjà ebulu zuru okè si n’ìgwè ewu na aturu puta, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie bayere ihe ọ mere n’amaghi-ama, ma ya onwe-ya amaghi ya, agāb͕aghara kwa ya ya.

19 Àjà-ikpe-ọmuma ka ọ bu: ikpe mara ya n’ezie n’iru Jehova.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 6

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Mb͕e madu gēmehie, mekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ghọb͕u madu-ibe-ya n’ihe-ndebe, ma-ọbu n’ihe etiyere n’aka-ya, ma-ọbu n’ihe anapuru madu n’ike, ma-ọbu mb͕e ọ meb͕uworo madu-ibe-ya;

3 ma-ọbu mb͕e ọ hutaworo ihe furu efu, o we ghọ aghughọ nime ya, ṅu iyi n’ugha; n’otù nime ihe ndia nile nke madu nēme, nēmehie nime ha:

4 o gēru kwa, mb͕e ọ gēmehie, mb͕e ikpe mara ya, na ọ gēnyeghachi ihe ọ napuru madu n’ike, ma-ọbu ihe ọ nwetara na nmeb͕u, ma-ọbu ihe-ndebe enyere ya idebe, ma-ọbu ihe furu efu nke ọ huta-woro,

5 ma-ọbu ihe ọ bula nke ọ ṅuru iyi bayere ya n’ugha; o gākwughachi kwa ya na nkwuzu-ya, ọ bu kwa otù uzọ n’uzọ ise ka ọ gātukwasi ya: ọ bu onye nwe ihe ahu ka ọ gēnye ya, n’ubọchi àjà-ikpe-ọmuma-ya.

6 Ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè sitere n’ìgwè ewu na aturu, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ọ gēwetara onye-nchu-àjà:

7 onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n’iru Jehova, agāb͕aghara kwa ya ya; bayere ihe ọ bula nime ihe nile nke ọ nēme, nke ikpe mara ya nime ya.

8 Jehova we gwa Moses okwu, si,

9 Nye Eron na umu-ya ndikom iwu, si, Nka bu iwu nke àjà-nsure-ọku: nke ahu bu àjà-nsure ọku bayere orire-ọku n’elu ebe-ichu-àjà ogologo abali nile rue ututu, agēme kwa ka ọku ebe-ichu-àjà nēre ere n’elu ya.

10 Onye-nchu-àjà gēyiri kwa uwe-nwuda ákwà ọcha ya, uwe-ukwu ákwà ọcha ya ka o gēyikwasi kwa n’anu-aru-ya; ọ gāchili kwa ntu ahu nke ọku gērechaputa n’àjà-nsure-ọku n’elu ebe-ichu-àjà, dọba ha na nso ebe-ichu-àjà.

11 O gēyipu uwe-ya, yiri uwe ọzọ, bupu ntu ahu je n’azu ọmuma-ulo-ikwū, rue ebe di ọcha.

12 Agēme kwa ka ọku nke di n’elu ebe-ichu-àjà nēre ere n’elu ya, ọ gaghi-anyu anyu; onye-nchu-àjà gēsure nkú ọku n’elu ya kwa-ututu: o gēdo kwa àjà-nsure-ọku n’usoro n’elu ya, sure kwa abuba nke àjà-udo nile ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’elu ya.

13 Mb͕e dum ka agēme ka ọku nēre ere n’elu ebe-ichu-àjà; ọ gaghi-anyu anyu.

14 Nka bu kwa iwu onyinye-inata-iru-ọma: umu-ndikom Eron gēweta ya nso n’iru Jehova, n’iru ebe-ichu-àjà.

15 O gēsite nime ya weju nweju-aka-ya weli, bú site n’utu ọka flour nke onyinye-inata-iru-ọma, site kwa na manu-ya, weli kwa frankincense nile nke di n’elu onyinye-inata-iru-ọma ahu, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’elu ebe-ichu-àjà ka ọ buru ihe ísì utọ, dika ihe-ncheta-ya, anēsurere Jehova.

16 Ma ihe fọduru nime ya, Eron na umu-ya ndikom gēri ya: nēkoghi eko ka agēri ya n’ebe di nsọ; n’ogige ulo-ikwū nzute ka ha gēri ya.

17 Agaghēwere ihe nēko achicha sie ya. Enyewom ya ka ọ buru òkè-ha sitere n’àjà-ọkum nile; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, dika àjà-nmehie, na dika àjà-ikpe-ọmuma.

18 Nwoke ọ bula n’etiti umu Eron gēri ya, dika ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile, site n’àjà-ọku nke Jehova: onye ọ bula nke nēmetu ha aru gādi nsọ.

19 Jehova we gwa Moses okwu, si,

20 Nka bu onyinye iji biaru nso nke Eron na umu-ya ndikom, nke ha gēwetara Jehova nso n’ubọchi etere ya manu; otù uzọ n’uzọ iri nke ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-ọma mb͕e dum, nkera-ya n’ututu, nkera-ya kwa n’anyasi.

21 N’ite isi ihe ka agēwere manu me ya; mb͕e ọ deworo edè i gēwebata ya: iberibe achicha esiri esi nke onyinye-inata-iru-ọma ka i gēweta nso ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova.

22 Onye-nchu-aja etere manu nke gānọchi ya site n’umu-ya ndikom gēme ya: ọ bu ukpuru ebighi-ebi Jehova nwere; agēsuresi ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

23 Onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke onye-nchu-àjà ka agēsuresi kwa oku: agaghi-eri ya.

24 Jehova we gwa Moses okwu, si,

25 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, okwu, si, Nka bu iwu àjà-nmehie: n’ebe anēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka agēb͕u ihe àjà-nmehie n’iru Jehova: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.

26 Onye-nchu-àjà nke nāchu ya bayere nmehie gēri ya; n’ebe di nsọ ka agēri ya, n’ogige ulo ikwū nzute.

27 Ihe ọ bula nke nēmetu anu-ya aru gādi nsọ: mb͕e efesara ufọdu nime ọbara-ya n’uwe ọ bula, i gāsu kwa ihe ahu efesara ya n’elu ya n’ebe di nsọ.

28 Ma agētiwa ihe ájá nke esiri ya nime ya: ma ọ buru na n’ihe ọla ka esiri ya, agēchicha ya, ṅacha ya na miri.

29 Nwoke ọ bula n’etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.

30 Ọ dighi kwa àjà-nmehie ọ bula agēri, bú nke anēwebata ufọdu nime ọbara-ya n’ulo-ikwū nzute ikpuchi nmehie n’ebe nsọ ahu: agēwere ọku sure ya.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 7

1 Nka bu kwa iwu àjà-ikpe-ọmuma: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.

2 N’ebe ha nēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka ha gēb͕u ihe àjà-ikpe-ọmuma; ọ gāwusa kwa ọbara-ya n’ebe-ichu-àjà buruburu.

3 Abuba-ya nile ka ọ gēsi nime ya weta nso; bú akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime,

4 na akọrọ abua, na abuba nke di n’elu ha, nke di n’akuku úkwù, na mba-imeju nke di n’imeju, (n’akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya):

5 onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsi ísì utọ n’ebe-ichu-àjà ka ọ buru àjà-ọku anāchuru Jehova: àjà-ikpe-ọmuma ka ọ bu.

6 Nwoke ọ bula n’etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: n’ebe di nsọ ka agēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.

7 Dika àjà-nmehie si di, otú a ka àjà-ikpe-ọmuma di: otù iwu diri ha: onye-nchu-àjà nke nēwere ya ikpuchi nmehie, ya onwe-ya gēnwe ya.

8 Onye-nchu-àjà nke nēweta nso àjà-nsure-ọku nke onye ọ bula, onye-nchu-àjà onwe-ya gēnwe akpukpọ nke ihe àjà-nsure-ọku nke o wetaworo nso n’onwe-ya.

9 Ọzọ, onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke anēsi n’ite-ọku, na ihe ọ bula anēme n’ihe ighe ihe, na n’ite isi ihe, onye-nchu-àjà nke nēweta ya nso, ya onwe-ya gēnwe ya.

10 Ọzọ onyinye-inata-iru-ọma ọ bula, agwara manu, ma-ọbu nke kpọrọ akpọ, umu-ndikom Eron nile gēnwe ya, otù dika ibe-ya.

11 Nka bu kwa iwu nke ihe àjà nke àjà-udo nke madu gēweta nso Jehova.

12 Ọ buru na ọ weta ya nso ka ọ buru àjà-ekele, ọ gēweta kwa nso ob͕e achicha ekoghi-eko ufọdu nke agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na ob͕e achicha ufọdu agwara manu, nke utu ọka flour dere edè, tiyere àjà-ekele ahu.

13 N’elu ob͕e achicha koro eko ufọdu ka ọ gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso tiyere àjà-ekele nke àjà-udo-ya.

14 O gēsi kwa na ya weta nso otù nime onyinye ọ bula iji biaru nso ka ọ buru àjà-nbuli ibuliri Jehova; onye-nchu-aja nke nāwusa ọbara àjà-udo, ya onwe-ya gēnwe ya.

15 Agēri kwa anu nke àjà-ekele nke àjà-udo-ya n’ubọchi nke onyinye-ya iji biaru nso; ọ gaghi-adọba ufọdu nime ya rue ututu.

16 Ma ọ buru na àjà nke onyinye-ya iji biaru nso bu nkwa ma-ọbu àjà-afọ-ofufo, n’ubọchi ọ nēweta nso àjà-ya-ka agēri ya: n’echi-ya ka agēri kwa nke fọduru nime ya:

17 ma nke fọduru nime anu nke àjà ahu, agēji ọku sure ya n’ubọchi nke-atọ.

18 Ma ọ buru na erie ufọdu nime anu nke ihe àjà nke àjà-udo-ya n’ubọchi nke-atọ n’uzọ ọ bula, ọ gaghi-atọ utọ: onye nēweta ya nso, agaghi-agu ya nye ya: ihe-árú ka ọ gābu, madu nke nēri ufọdu nime ya gēbu kwa ajọ omume-ya.

19 Anu nke meturu ihe ọ bula ruru árú, agaghi-eri ya: agēji ọku sure ya. Ma anu àjà ahu, onye ọ bula nke di ọcha gēri anu-ya:

20 ma madu nke nēri anu sitere n’ihe àjà nke-udo, nke Jehova nwere, ma ọrurú-ya di n’aru ya, agēbipu madu ahu n’etiti umu-nna-ya.

21 Ma mb͕e madu gēmetu ihe ọ bula ruru árú aru, bú ọrurú madu, ma-ọbu anumanu ruru árú, maọbu ihe-árú ọ bula ruru árú, we rie ufọdu nime anu ihe àjà-udo, nke Jehova nwere, agēbipu madu ahu n’etiti umu-nna-ya.

22 Jehova we gwa Moses okwu, si,

23 Gwa umu Israel okwu, si, Unu erila abuba ọ bula, nke ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu.

24 Abuba nke anumanu nwuru onwe-ya, na abuba nke anumanu anu-ọhia dọb͕uru, agēdozi ya iji je ozi ọ bula: ma unu erila ya ma-ọli.

25 N’ihi na onye ọ bula nke nēri abuba sitere n’anumanu nke madu si nime ya eweta nso àjà-ọku ichuru Jehova, agēbipu kwa madu nke nēri ya n’etiti umu-nna-ya.

26 Ọ dighi kwa ọbara ọ bula unu gēri n’ebe-ọbibi-unu nile, nke anu-ufe, ma ọbu nke anumanu.

27 Madu ọ bula nke gēri ọbara ọ bula, agēbipu kwa madu ahu n’etiti umu-nna-ya.

28 Jehova we gwa Moses okwu, si,

29 Gwa umu Israel okwu, si, Onye nēwetara Jehova nso ihe àjà nke àjà-udo-ya gēsi n’ihe àjà nke àjà-udo-ya wetara Jehova onyinye-ya iji biaru nso:

30 aka ya gēweta àjà-ọku nke Jehova; abuba di n’akuku okpukpu-obi ka ọ gēweta, ya na okpukpu-obi, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n’iru Jehova.

31 Onye-nchu-àjà gēsure kwa abuba ahu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísi utọ n’ebe-ichu-àjà: ma okpukpu-obi ahu ka Eron na umu-ya ndikom gēnwe.

32 Utaku-ukwu aka-nri ka unu gēnye kwa onye-nchu-àjà ibu àjà-nbuli sitere n’ihe àjà nile nke àjà-udo-unu.

33 Onye ahu n’etiti umu-ndikom Eron nke nēweta nso ọbara nke àjà-udo nile, na abuba-ha, ya gēnwe utaku-ukwu aka-nri ahu ka ọ buru òkè-ya.

34 N’ihi na okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka M’naraworo n’aka umu Israel site n’ihe àjà nile nke àjà-udo-ha nile, nye Eron, bú onye-nchu-àjà, nye kwa umu-ya ndikom, n’ukpuru ebighi-ebi, sitere n’aka umu Israel.

35 Nka bu òkè otite-manu Eron, na òkè otite-manu umu-ya ndikom, sitere n’àjà-ọku nke Jehova, n’ubọchi O mere ka ha biarue nso iburu Jehova ndi-nchu-àjà;

36 bú nke Jehova nyere iwu ka enye ha site n’aka umu Israel, n’ubọchi O tere ha manu. Ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile.

37 Nka bu iwu diri àjà-nsure-ọku, di-kwa-ra onyinye-inata-iru-ọma, di-kwa-ra àjà-nmehie, di-kwa-ra àjà-ikpe-ọmuma, di-kwa-ra nmeju-aka, di-kwa-ra ihe àjà nke àjà-udo;

38 nke Jehova nyere Moses n’iwu n’ugwu Sainai, n’ubọchi O nyere umu Israel iwu iwetara Jehova nso onyinye-ha iji biaru nso, n’ọzara Sainai.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 8

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Chiri Eron na umu-ya ndikom tiyere ya, na uwe-ha, na manu otite-manu ahu, na oke-ehi nke àjà-nmehie, na ebulu abua ahu, na nkata achicha ekoghi-eko;

3 kpọkọta kwa nzukọ Israel nile n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

4 Moses we me dika Jehova nyere ya iwu; ewe kpọkọta nzukọ ahu n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

5 Moses we si nzukọ ahu, Nka bu ihe Jehova nyere n’iwu ka eme ya.

6 Moses we me ka Eron na umu-ya ndikom biaru nso, o were kwa miri sa ha aru.

7 O tiye n’aru ya uwe-ime ahu, were ihe ike n’úkwù ke ya, yikwasi ya uwe-nwuda, tiye ephod n’aru ya, ke ya n’ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara, were ya kegide ephod ahu n’aru ya.

8 Ọ tukwasi n’aru ya ihe-ib͕ochi-obi; tiye kwa n’elu ihe-ib͕ochi-obi Ìhè ahu na Izu-okè ahu.

9 Ọ tukwasi ákwà-nkukù-isi n’isi-ya; tukwasi kwa n’ákwà-nkukù-isi ahu, n’iru ya, ihe ahu di mbara nke ọla-edo, bú okpu nsọ nke onye-nchu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.

10 Moses we were manu otite-manu ahu, te ebe-obibi ahu na ihe nile nke di nime ya, do ha nsọ.

11 Ọ we fesa ufọdu nime ya n’ebe-ichu-àjà ub͕ò asa, te kwa ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri na ukwu-ala-ya, manu, ido ya nsọ.

12 Ọ wukwasi kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu n’isi Eron, te kwa ya manu, ido ya nsọ.

13 Moses we me ka umu-ndikom Eron biaru nso, o yikwasi ha uwe-ime, were ihe ike n’úkwù ke ha, ke kwa ha ihe ike n’isi; dika Jehova nyere Moses iwu.

14 Ọ kputa oke-ehi nke àjà-nmehie nso: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n’oke-ehi nke àjà-nmehie.

15 O b͕ue ya; Moses we were ọbara-ya, tiye ya n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu buruburu na nkpisi-aka-ya, wepu nmehie n’ebe-ichu-àjà ahu: ọbara ahu ka ọ wusi-kwa-ra na ntọ-ala ebe-ichu-àjà, do ya nsọ, ikpuchiri ya nmehie.

16 Ọ were abuba nile nke di n’elu ihe-ime, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ abua, na abuba-ha, Moses we sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-àjà.

17 Ma oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na anu-ya, na nsi-ya, o surere ha n’ọku n’azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Jehova nyere Moses iwu.

18 Ọ weta nso ebulu nke àjà-nsure-ọku: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n’isi ebulu ahu.

19 O b͕ue ya: Moses we wusa ọbara-ya n’ebe-ichu-àjà ahu buruburu.

20 Ọ bọ ebulu ahu n’ọbubọ-ya; Moses we sure isi-ya na ọbubọ-ya nile na abuba-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

21 Ọ were miri sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya; Moses we sure ebulu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku ka ọ bu ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu; dika Jehova nyere Moses iwu.

22 Ọ we weta nso ebulu nke-ọzọ, bú ebulu nke nmeju-aka: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n’isi ebulu ahu.

23 O b͕ue ya; Moses we were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n’ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n’isi-aka nke aka-nri-ya, na n’isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya.

24 Ọ me ka umu-ndikom Eron biaru nso, Moses we were ufọdu nime ọbara ahu, tiye n’ọnu-ọnu nti aka-nri ha, na n’isi-aka nke aka-nri-ha, na n’isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha: Moses we wusa ọbara ahu n’ebe-ichu-àjà buruburu.

25 Ọ were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nile nke di n’elu ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba-ha, na utaku-ukwu aka-nri ya:

26 o si na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n’iru Jehova were otù ob͕e achicha ekoghi-eko, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, tukwasi ha n’abuba ahu na n’utaku-ukwu aka-nri:

27 o tiye ha nile n’elu ọbu-aka abua nke Eron, na n’elu ọbu-aka nke umu-ya ndikom, we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n’iru Jehova.

28 Moses we wepu ha n’elu ọbu-aka-ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-àjà n’elu àjà-nsure-ọku ahu: nmeju-aka ka ha bu, ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu.

29 Moses were kwa okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n’iru Jehova: òkè Moses nwere ka ọ bu sitere n’ebulu nmeju-aka; dika Jehova nyere Moses iwu.

30 Moses were kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu, na ufọdu nime ọbara nke di n’elu ebe-ichu-àjà, fesa n’aru Eron, na n’elu uwe-ya, na n’aru umu-ya ndikom, na n’elu uwe umu-ya ndikom tiyere ya; ọ we do Eron nsọ, do kwa uwe-ya, na umu-ya ndikom, na uwe umu-ya ndikom, nsọ tiyere ya.

31 Moses we si Eron na umu-ya ndikom, Sienu anu-ya n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: ọ bu kwa n’ebe ahu ka unu gēri ya na achicha nke di na nkata nke nmeju-aka ahu, dika m’nyere n’iwu, si, Eron na umu-ya ndikom gēri ya.

32 Ma ihe nke fọduru nime anu ahu na nime achicha ahu, n’ọku ka unu gēsure ya.

33 Unu esi-kwa-la n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute pua ubọchi asa, rue ubọchi mb͕e ubọchi nile nke nmeju-aka-unu gēzu: n’ihi na ubọchi asa ka Ọ ganēmeju aka-unu.

34 Dika emere ta, otú a ka Jehova nyere iwu ime, ikpuchiri unu nmehie-unu.

35 Ọ bu kwa n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute ka unu gānọgide ehihie na abali ubọchi asa, debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, ka unu we ghara inwu: n’ihi na otú a ka enyeworom iwu.

36 Eron na umu-ya ndikom we me ihe nile Jehova nyere n’iwu site n’aka Moses.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 9

1 O rue, n’ubọchi nke-asatọ, na Moses kpọrọ Eron na umu-ya ndikom, na ndi-okenye Israel;

2 ọ si Eron, Were n’onwe-gi nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nmehie, na ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku, nke zuru okè ka ha gābu, gi weta kwa ha nso n’iru Jehova.

3 Umu Israel ka i gāgwa kwa okwu, si, Werenu nkpi ka ọ buru àjà-nmehie; na nwa-ehi na nwa-aturu, ha abua gāb͕a otù arọ, bú nke zuru okè, ka ha buru àjà-nsure-ọku;

4 chiri kwa ehi na ebulu ka ha buru àjà-udo, ichu n’iru Jehova; were kwa onyinye-inata-iru-ọma agwara manu: n’ihi na ta ka Jehova gēme ka unu hu Ya anya.

5 Ha we weta ihe Moses nyere n’iwu n’iru ulo-ikwū nzute: nzukọ Israel nile we biaru nso guzo kwa n’iru Jehova.

6 Moses we si, Nka bu ihe Jehova nyere n’iwu ka unu me: agēme kwa ka unu hu ebube Jehova anya.

7 Moses we si Eron, Biarue ebe-ichu-àjà nso, me àjà-nmehie-gi, na àjà-nsure-ọku-gi, kpuchiere onwe-gi, kpuchi-kwa-ra ndi Israel, nmehie-unu; me kwa onyinye iji biaru nso nke ndi ahu, kpuchi-kwa-ra ha nmehie-ha; dika Jehova nyere iwu.

8 Eron we biarue ebe-ichu-àjà nso, b͕ue nwa-ehi nke àjà-nmehie nke diri ya onwe-ya.

9 Umu-ndikom Eron we wetara ya nso ọbara-ya: ọ we deye nkpisi-aka-ya n’ọbara ahu, tiye n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà, we wusi ọbara na ntọ-ala ebe-ichu-àjà:

10 ma abuba, na akọrọ abua, na mba-imeju nke putara n’imeju, nke si n’àjà-nmehie puta, o surere ha ọku ibu ihe-nsure ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.

11 Ma anu-ya na akpukpọ-ya, o surere ha n’ọku n’azu ọmuma-ulo-ikwū.

12 Ọ we b͕ue ihe àjà-nsure-ọku: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n’ebe-ichu-àjà buruburu.

13 Àjà-nsure-ọku ka ha me-kwa-ra ka o rue ya aka, n’ọbubọ, na isi-ya; ọ we sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’elu ebe-ichu-àjà.

14 Ọ we sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’elu àjà-nsure-ọku n’ebe-ichu-àjà.

15 Ọ we weta nso onyinye iji biaru nso nke ndi Israel, were nkpi nke àjà-nmehie nke diri ndi ahu, b͕ue ya, chua ya n’àjà bayere nmehie, dika nke-mbu.

16 Ọ weta kwa àjà-nsure-ọku nso, me ya dika ikpé bayere ya si di.

17 Ọ weta kwa nso onyinye-inata-iru-ọma, si nime ya meju ọbu-aka-ya, sure ya ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’elu ebe-ichu-àjà, tiyere àjà-nsure-ọku nke ututu.

18 O b͕u-kwa-ra ehi ahu na ebulu ahu, bú ihe àjà nke àjà-udo, nke diri ndi Israel: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n’ebe-ichu-àjà buruburu,

19 ha me-kwa-ra ka abuba nile nke putara n’ehi ahu rue ya aka; na ihe putara n’ebulu ahu, bú akuku ọdudu nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na akọrọ abua, na mba-imeju nke imeju:

20 ha we tukwasi abuba ahu n’okpukpu-obi, ọ we sure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n’ebe-ichu-àjà:

21 ma okpukpu-obi-ha na utaku-ukwu aka-nri ka Eron fere ka ha buru àjà-ofufé n’iru Jehova; dika Moses nyere iwu.

22 Eron we chilie aka-ya n’ebe ndi Israel nọ, gọzie ha; o si n’ime àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku na àjà-udo rida.

23 Moses na Eron we ba n’ulo-ikwū nzute, puta kwa, gọzie ndi Israel: ewe me ka ndi ahu nile hu ebube Jehova anya.

24 Ọku we si n’iru Jehova puta, ripia àjà-nsure-ọku na abuba nile n’elu ebe-ichu-àjà: ndi Israel nile we hu ya, tie nkpu, da kpue iru-ha n’ala.

Categories
LEVITIKỌS

LEVITIKỌS 10

1 Ma umu-ndikom Eron, bú Nedab na Abaihu, were ihe-igu-ọku, onye ọ bula ọ were nke ya, ha we tiye ọku nime ha, tukwasi ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’elu ya, we weta nso n’iru Jehova ọku ala ọzọ, nke Ọ nēnyeghi ha n’iwu.

2 Ọku we si n’iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n’iru Jehova.

3 Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N’aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n’iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti.

4 Moses we kpọ Mishael na Elzafan, bú umu-ndikom Uziel nwa-nne nna Eron, si ha, Biaruenu nso, si n’iru ebe nsọ a bupu umu-nne-unu je n’azu ọmuma-ulo-ikwū.

5 Ha we biaru nso, buru ha n’uwe-ime-ha je n’azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Moses kwuru.

6 Moses we si Eron, ọ si kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom, Unu akọpula agiri-isi-unu, unu adọwa-kwa-la uwe-unu; ka unu we ghara inwu, ka Ọ we ghara kwa iwe iwe megide nzukọ Israel nile: ma ka umu-nne-unu, bu ulo nile nke Israel, kwara nsure-ọku ahu nke Jehova sureworo akwá.

7 Unu esi-kwa-la n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute pua, ka unu we ghara inwu: n’ihi na manu otite-manu nke Jehova dikwasi unu. Ha we me dika okwu Moses si di.

8 Jehova we gwa Eron okwu, si,

9 Aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n’anya, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom tiyere gi, mb͕e unu nābà n’ulo-ikwū nzute, ka unu we ghara inwu; ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile:

10 ka unu we kpa kwa ókè n’etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, na n’etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha;

11 ka unu we zí kwa umu Israel ukpuru nile nke Jehova gwaworo ha site n’aka Moses.

12 Moses we gwa Eron okwu, ọ gwa kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom fọduru, si, Werenu onyinye-inata-iru-ọma nke fọduru site n’àjà-ọku nke Jehova, rie ya n’ekoghi-eko na nso ebe-ichu-àjà: n’ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.

13 Unu gēri kwa ya n’ebe di nsọ, n’ihi na òkè-gi, na òkè umu-gi ndikom, ka ọ bu, sitere n’àjà-ọku nile nke Jehova: n’ihi na otú a ka enyeworom iwu.

14 Okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka unu gēri kwa n’ebe di ọcha; gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na umu-gi ndinyom tiyere gi: n’ihi na dika òkè-gi na òkè umu-gi ndikom ka enyeworo ha site n’ihe àjà nile nke àjà-udo nile nke umu Israel.

15 Utaku-ukwu nke àjà-nbuli na okpukpu-obi nke àjà-ofufé ka ha gēweta n’elu àjà-ọku nile nke abuba nile, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n’iru Jehova: ọ gābu kwa nke gí, na nke umu-gi ndikom tiyere gi, dika òkè-unu ebighi-ebi; dika Jehova nyere iwu.

16 Moses we chọsie nkpi nke àjà-nmehie ike, ma, le, esurewo ya ọku: ọ we iwe n’aru Eleeza na n’aru Itama, bú umu-ndikom Eron fọduru, si,

17 Gini mere unu erighi àjà-nmehie n’ebe nke ebe nsọ ahu? n’ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, ọ bu kwa ya ka O nyeworo unu ibupu ajọ omume nke nzukọ Israel, ikpuchiri ha nmechie-ha n’iru Jehova.

18 Le, ebubataghi ọbara-ya n’ebe nsọ a nime: unu aghaghi iri ya n’ebe nsọ a, dika m’nyere iwu.

19 Eron we gwa Moses okwu, si, Le, ta ka ha wetaworo àjà-nmehie-ha na àjà-nsure-ọku-ha nso n’iru Jehova; ihe dika ihe ndia we dakwasim: asi kwa na eririm àjà-nmehie ahu ta, ọ̀ gādi nma n’anya Jehova?

20 Mb͕e Moses nuru ya, ọ we di nma n’anya-ya.