Categories
JOSHUA

JOSHUA 21

1 Ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai we biarue nso Eleeza, bú onye-nchu-àjà, biaru kwa nso Joshua nwa Nun, biaru kwa nso ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel;

2 ha we gwa ha okwu nime Shailo n’ala Kenean, si, Jehova nyere iwu n’aka Moses inye ayi obodo ufọdu ayi gēbi, ha na ebe-ita-nri-ha nke gādiri anu-ulo-ayi.

3 Umu Israel we si n’ihe-nketa-ha nye ndi Livai, dika okwu-ọnu Jehova si di, obodo ndia na ebe-ita-nri-ha.

4 Ife-nzà we putara ab͕uru nile nke ndi Kohat: umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ndi sitere na ndi Livai, we nwe obodo iri na atọ sitere n’ebo Juda, site kwa n’ebo ndi Simeon, site kwa n’ebo Benjamin, n’ife-nzà.

5 Umu Kohat fọduru we nwe obodo iri sitere n’ab͕uru nile nke ebo Efraim, site kwa n’ebo Dan, site kwa na nkera ebo Manase, n’ife-nzà.

6 Umu Giashon we nwe obodo iri na atọ sitere n’ab͕uru nile nke ebo Isaka, site kwa n’ebo Asha, site kwa n’ebo Naftali, site kwa na nkera ebo Manase nime Beshan, n’ife-nzà.

7 Umu Merari dika ab͕uru nile ha si di we nwe obodo iri na abua sitere n’ebo Reuben, site kwa n’ebo Gad, site kwa n’ebo Zebulun.

8 Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha n’ife-nzà, dika Jehova nyere iwu n’aka Moses.

9 Ha we si n’ebo umu Juda, si kwa n’ebo umu Simeon, nye obodo ndia nke akpọrọ ha n’aha n’ebe a:

10 ha we diri umu Eron, ndi sitere n’ab͕uru ndi Kohat, ndi sitere n’umu Livai: n’ihi na ha ka ife-nzà mbu diri.

11 Ha we nye ha Kiriat-aba, nna Anak ka Aba ahu bu, (nke ahu bu Hebron,) n’ugwu Juda, ya na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya.

12 Ma ọhia nke obodo ahu, na obodo ntà ya nile, ka ha nyere Keleb nwa Jefune n’ihe-onwunwe-ya.

13 Umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha nyere Hebron na ebe-ita-nri-ya, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Libna na ebe-ita-nri-ya nile;

14 na Jatia na ebe-ita-nri-ya nile, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile,

15 na Holon na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile;

16 na Ain na ebe-ita-nri-ya nile, na Juta na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile; obodo iteghete site n’ebo abua ahu.

17 Site kwa n’ebo Benjamin, Gibeon na ebe-ita-nri-ya nile, na Geba na ebe-ita-nri-ya nile;

18 na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile, na Almon na ebe-ita-nri-ya nile: obodo anọ.

19 Obodo nile nke umu Eron, bú ndi-nchu-àjà, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha.

20 Ab͕uru nile nke umu Kohat, bú ndi Livai, bú ndi fọduru site n’umu Kohat, ha nwere obodo ife-nzà-ha site n’ebo Efraim.

21 Ha we nye ha Shekem na ebe-ita-nri-ya nile n’ugwu Efraim, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Gezea na ebe-ita-nri-ya nile;

22 na Kibzaim na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.

23 Site kwa n’ebo Dan, Elteke na ebe-ita-nri-ya nile, na Gibeton na ebe-ita-nri-ya nile;

24 na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.

25 Site kwa na nkera ebo Manase, Tanak na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo abua.

26 Obodo nile di iri, ha na ebe-ita-nri-ha, bú nke diri ab͕uru umu Kohat fọduru.

27 Ha nye-kwa-ra umu Giashon, ndi sitere n’ab͕uru ndi Livai, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu; na Be-eshtera na ebe-ita-nri-ya nile, site na nkera ebo Manase; obodo abua.

28 Site kwa n’ebo Isaka, Kishion na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile;

29 na Jamut na ebe-ita-nri-ya nile, na En-ganim na ebe-ita-nri-ya nile, obodo anọ.

30 Site kwa n’ebo Asha, Mishal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile;

31 na Helkat na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.

32 Site kwa n’ebo Naftali, Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Hamot-doa na ebe-ita-nri-ya nile, na Katan na ebe-ita-nri-ya nile; obodo atọ.

33 Obodo nile nke ndi Giashon, dika ab͕uru nile ha si di, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha.

34 Ha nye-kwa-ra ab͕uru nile nke umu Merari, bú Livai fọduru, Jokneam na ebe-ita-nri-ya nile; na Kata na ebe-ita-nri ya nile,

35 na Dimna na ebe-ita-nri-ya nile, na Nahalal na ebe-ita-nri-ya nile, sitere n’ebo Zebulun; obodo anọ.

36 Site kwa n’ebo Reuben, Beza na ebe-ita-nri-ya nile, na Jehaz na ebe-ita-nri-ya nile,

37 na Kedimot na ebe-ita-nri-ya nile, na Mefaat na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.

38 Site n’ebo Gad, Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile;

39 na Heshbon na ebe-ita-nri-ya nile, na Jeza na ebe-ita-nri-ya nile; obodo ahu nile di anọ.

40 Obodo ahu nile diri umu Merari dika ab͕uru nile ha si di, bú ndi fọduru site n’ab͕uru nile nke ndi Livai; ihe-ife-nzà-ha we di obodo iri na abua.

41 Obodo nile nke ndi Livai n’etiti ihe-onwunwe umu Israel di ọgu obodo abua na asatọ na ebe-ita-nri-ha.

42 Obodo ndia di otú a, obodo ọ bula na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya: otú a ka ọ diri obodo ndia nile.

43 Jehova we nye Israel ala ahu nile nke Ọ ṅuru iyi inye ndi bu nna-ha; ha we nweta ya, we biri nime ya.

44 Jehova we me ka ha zuru ike buruburu, dika ihe nile si di nke Ọ ṅuru ndi bu nna-ha iyi: ọ dighi kwa nwoke ọ bula n’etiti ndi-iro-ha nile guzoro n’iru ha; ndi-iro-ha nile ka Jehova nyere n’aka-ha.

45 Ọ dighi ihe ọ bula dapuru n’ezi ihe nile nke Jehova gwara ulo Israel; ha nile mere.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 22

1 Mb͕e ahu Joshua kpọrọ ndi Reuben, kpọ kwa ndi Gad, kpọ kwa nkera ebo Manase,

2 si ha, Unu onwe-unu edebewo ihe nile nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n’iwu, unu egewo kwa nti olum n’ihe nile m’nyere unu n’iwu:

3 unu arapughi umu-nne-unu ọtutu ubọchi ndia rue ta, ma unu edebewo ihe-ndebe nke ihe Jehova, bú Chineke-unu, nyere n’iwu.

4 Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka umu-nne-unu zuru ike, dika Ọ gwara ha okwu: ub͕u a kwa chigharianu, jerue ulo-ikwū-unu n’onwe-unu, rue ala ihe-onwunwe-unu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n’ofè Jọdan.

5 Nání, lezienu anya nke-ọma ime ihe enyere n’iwu na iwu ahu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n’iwu, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n’anya, na ije íjè n’uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n’iwu, na irapara n’aru Ya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè.

6 Joshua we gọzie ha, zilaga ha: ha we jerue ulo-ikwū-ha.

7 Ma nkera ebo Manase ka Moses nyere ihe-nketa nime Beshan: ma Joshua nyere nkera-ya ọzọ ihe-nketa n’etiti umu-nne-ha n’ofè Jọdan n’akuku Ọdida-anyanwu. Ọzọ kwa, mb͕e Joshua zilagara ha n’ulo-ikwū-ha, ọ gọzie ha,

8 gwa ha okwu, si, Werenu ọtutu àkù laghachi n’ulo-ikwū-unu, were kwa anu-ulo bara uba nke-uku, were kwa ọla-ọcha, were kwa ọla-edo, were kwa ọla, were ígwè, were kwa uwe bara uba nke-uku: soronu umu-nne-unu kere ihe-nkwata ndi-iro-unu.

9 Umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we laghachi, si n’ebe umu Israel nọ site na Shailo, nke di n’ala Kenean, ga, ijeru ala Gilead, iru ala ihe-onwunwe-ha, nke ha nwere ihe-onwunwe nime ya, dika okwu-ọnu Jehova n’aka Moses si di.

10 Ha we biarue buruburu-ala Jọdan, nke di n’ala Kenean, umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we wue ebe-ichu-àjà n’ebe ahu n’akuku Jọdan, bú ebe-ichu-àjà uku n’ile ya anya.

11 Umu Israel we nu, si, Le, umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase ewuwo ebe-ichu-àjà na ncherita-iru ala Kenean, nime buruburu-ala Jọdan, n’ofè umu Israel nwe.

12 Mb͕e umu Israel nuru ya, nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha nime Shailo, irigokuru ha ibu agha.

13 Umu Israel we ziga Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ijekuru umu Reuben, na ijekuru umu Gad, na ijekuru nkera ebo Manase, rue ala Gilead;

14 ya na ndi-isi iri, otù onye-isi otù onye-isi diri ulo nna ọ bula, inọrọ ebo nile nke Israel; ha nile n’otù n’otù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha ka ha bu, ha diri usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Israel.

15 Ha we biakute umu Reuben, biakute kwa umu Gad, biakute kwa nkera ebo Manase, rue ala Gilead, ha we gwa ha okwu, si,

16 Otú a ka nzukọ nile nke Jehova siri, Gini bu ihe-nmekpu a nke unu mekpuworo megide Chineke Israel, isi n’iso Jehova chigharia ta, n’iwuru onwe-unu ebe-ichu-àjà, inupu isi n’okpuru Jehova ta?

17 Ọ̀ bu na ajọ omume Peoa diri ayi ntà, nke ayi nāsapughi onwe-ayi na ya rue ta, ihe-otiti ahu we si nime nzukọ Jehova,

18 na unu onwe-unu gēsi n’iso Jehova chigharia ta? ọ gēru kwa, ọ buru na unu anupu isi ta n’okpuru Jehova, na Ọ gēwesa nzukọ nile nke Israel iwe echi.

19 Otú ọ di, ọ buru na ala ihe-onwunwe-unu arua árú, gabigaranu onwe-unu rue ala ihe-onwunwe Jehova, ebe ebe-obibi Jehova nēbi, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe n’etiti ayi: ma unu anupula isi n’okpuru Jehova, unu anupu-kwa-la isi n’okpuru ayi, n’iwuru onwe-unu ebe-ichu-àjà nābughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi.

20 Ekan nwa Zera, ọ̀ mekpughi ihe-nmekpu n’ihe ahu ewezugara nye Jehova, ma n’aru nzukọ nile nke Israel ka iwe dikwasi? ma ọ bughi nání ya onwe-ya, bú otù onye, kubirì ume n’ajọ omume-ya.

21 Umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we za, gwa ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel okwu, si,

22 Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Ya onwe-ya mara, Israel kwa, ya onwe-ya gāmara; ọ buru na ọ bu nime nnupu-isi, ọ buru kwa na ọ bu nime nmekpu megide Jehova, (azọputala ayi ta,)

23 ka ayi wuworo onwe-ayi ebe-ichu-àjà isi n’iso Jehova chigharia; ọ buru kwa na ọ bu isure àjà-nsure-ọku ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma n’elu ya, ọ buru kwa na ọ bu ichu ihe àjà nke àjà-udo n’elu ya, ka Jehova Onwe-ya jua ase ya;

24 ọ buru kwa na ayi emeghi nka site n’iche uche okwu, si, N’ọdi-n’iru umu-unu gāgwa umu-ayi okwu, si, Gini ka unu na Jehova, bú Chineke nke Israel, nwekọrọ?

25 n’ihi na Jehova etiyewo ókè-ala n’etiti ayi na unu, umu Reuben na umu Gad, bú Jọdan; unu enweghi òkè nime Jehova: umu-unu ewe me ka umu-ayi kwusi n’itu egwu Jehova.

26 Ayi we si, Biko, ka ayi doziere onwe-ayi iwu ebe-ichu-àjà nka, ọ bughi isure àjà-nsure-ọku, ọ bughi kwa ichu àjà:

27 kama ihe-àmà ka ọ gābu n’etiti ayi na unu, na n’etiti ọb͕ọ nile nke umu-ayi ndi gānọchi ayi, ka ayi we were àjà-nsure-ọku nile ayi, were kwa àjà nile ayi, were kwa àjà-udo nile ayi, fè òfùfè Jehova n’iru Ya; ka umu-unu we ghara isi umu-ayi n’ọdi-n’iru, Unu enweghi òkè nime Jehova.

28 Ayi we si, O gēru kwa, mb͕e ha gāsi ayi, si kwa ọb͕ọ nile nke umu-ayi n’ọdi-n’iru, otú a, na ayi gāsi, Lenu ihe-atù nke ebe-ichu-àjà Jehova, nke nna-ayi-hà mere, ọ bughi isure àjà-nsure-ọku, ọ bughi kwa ichu àjà: kama ihe-àmà ka ọ bu n’etiti ayi na unu.

29 Ya buru ayi ihe-árú inupu isi n’okpuru Jehova, na isi n’iso Jehova chigharia ta, iwu ebe-ichu-àjà isure àjà-nsure-ọku, ma-ọbu inye onyinye-inata-iru-ọma, ma-ọbu ichu àjà, nāgughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, di n’íru ebe-obibi-Ya.

30 Finehas, bú onye-nchu-àjà, na ndi isi nzukọ Israel, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, ndi soro ya je, we nu okwu nile nke umu Reuben na umu Gad na umu Manase kwuru, ọ we di nma n’anya-ha.

31 Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we si umu Reuben, si kwa umu Gad, si kwa umu Manase, Ta ka ayi mara na Jehova nọ n’etiti ayi, n’ihi na unu emekpughi ihe-nmekpu a megide Jehova: ub͕u a ka unu naputaworo umu Israel n’aka Jehova.

32 Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi we si n’ebe umu Reuben nọ, na ebe umu Gad nọ, n’ala Gilead, lata, rue ala Kenean, lakuru umu Israel, we weghachiri ha okwu.

33 Okwu ahu we di nma n’anya umu Israel; umu Israel we gọzie Chineke, ha ekwughi kwa okwu irigokuru ha ibu agha, ibibi ala nke umu Reuben na umu Gad nēbi nime ya.

34 Umu Reuben na umu Gad we kpọsa okwu bayere ebe-ichu-àjà ahu, N’ihi na, ka ha kwuru, ihe-àmà ka ọ bu n’etiti ayi, na Jehova bu Chineke.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 23

1 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri site na mb͕e Jehova mere ka Israel zuru ike pua n’aka ndi-iro-ha nile buruburu, mb͕e Joshua ghọrọ agadi, mb͕e ubọchi ndu-ya nāgwu,

2 na Joshua kpọrọ Israel nile, bú ndi-okenye-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha, si ha, Mu onwem aghọwo agadi, ubọchi ndum nāgwu:

3 unu onwe-unu ahuwo kwa ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, meworo mba ndia nile n’ihi unu; n’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù.

4 Lenu, emewom ka mba ndia nke fọduru dayere unu n’ihe-nketa diri ebo nile unu, site na Jọdan, ha na mba ahu nile ndi m’bipuworo, we rue oké osimiri uku ahu n’ọdida anyanwu.

5 Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya gākwapu kwa ha n’iru unu, napu kwa ha ala-ha n’iru unu; unu gēnweta kwa ala-ha, dika Jehova, bú Chineke-unu, gwara unu okwu.

6 Di-kwa-nu ike nke-uku idebe na ime ihe nile edeworo n’akwukwọ iwu Moses, ka unu ghara isi nime ya wezuga onwe-unu n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe;

7 ka unu ghara ibà nime mba ndia, ndi fọduru n’etiti unu; unu ehota-kwa-la aha chi nile ha, unu eme-kwa-la ka ewere ha ṅua iyi, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha:

8 kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gārapara n’aru, dika unu meworo rue ta.

9 Jehova nānapu kwa mba uku nke nwere ume ala-ha n’iru unu: ma unu onwe-unu, ọ dighi nwoke ọ bula guzoworo n’iru unu rue ta.

10 Otù nwoke nime unu nāchu nnù ndikom abua na ọgu iri: n’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù, dika Ọ gwara unu okwu.

11 Lezi-kwa-nu onwe-unu anya nke-ọma, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n’anya.

12 Ma ọ buru na unu alaghachi ma-ọli, we rapara n’aru ndi fọduru nke mba ndia, bú ndia fọduru n’etiti unu, unu na ha ewe lurita nwunye, unu ewe bakuru ha, ha ewe bakuru kwa unu:

13 maranu nke-ọma na Jehova, bú Chineke-unu, agaghi-anapu kwa mba ndia ala-ha ọzọ n’iru unu, kama ha gāburu unu ib͕udu na ọnyà, na utari n’akuku-aru-unu, na ogwu n’anya-unu, rue mb͕e unu gālapu n’iyì n’ezi ala nka, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu.

14 Ma, le, mu onwem nēje n’uzọ uwa nile ta: ma unu amawo n’obi-unu nile na nime nkpuru-obi-unu nile, na ọ dighi otù ihe dapuru n’ezi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, kwuru bayere unu; ha nile emeworo unu, ọ dighi otù ihe dapuru nime ya.

15 Ọ gēru kwa, na dika ezi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, gwara unu biakwasiworo unu, otú a ka Jehova gēme ka ihe ọjọ ahu nile biakwasi unu, rue mb͕e Ọ gēkpochapu unu n’ezi ala nka nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu.

16 Mb͕e unu gāgabiga ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, nke O nyere unu n’iwu, mb͕e unu gēje kwa fè chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha; iwe Jehova gādi kwa ọku n’aru unu, unu gālapu kwa n’iyì ngwa ngwa n’ezi ala ahu nke O nyeworo unu.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 24

1 Joshua we chikọta ebo nile nke Israel rue Shekem, ọ kpọ ndi-okenye Israel, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha; ha we guzo onwe-ha n’iru Chineke.

2 Joshua we si ndi Israel nile, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, N’ofè Osimiri ahu ka nna-unu-hà biri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, bú Tira, nna Abraham, na nna Nehoa: ha we fè chi ọzọ di iche iche.

3 M’we si n’ofè Osimiri ahu kuru nna-unu, bú Abraham, me ka ọ nēje ije n’ala Kenean nile, M’we me ka nkpuru-ya ba uba, M’we nye ya Aisak.

4 M’we nye Aisak Jekob na Isọ: M’we nye Isọ ugwu Sia, ka ọ nweta ya; ma Jekob na umu-ya ridara n’Ijipt.

5 M’we ziga Moses na Eron, tie Ijipt ihe, dika ihe ahu si di nke M’mere n’etiti ya: emesia M’we me ka unu puta.

6 M’we me ka nna-unu-hà si n’Ijipt puta: unu we biarue oké osimiri; ndi Ijipt we chiri ub͕ọ-ala na ndi-inyinya chua nna-unu-hà n’azu rue Oké Osimiri Uhie.

7 Ha we tikue Jehova, O we tiye oké ọchichiri n’etiti unu na ndi Ijipt, me ka oké osimiri biakwasi ha, O we kpuchie ha; anya-unu hu-kwa-ra ihe M’mere n’Ijipt: unu we biri n’ọzara ọtutu ubọchi.

8 M’we me ka unu ba n’ala ndi-Amorait, ndi bi n’ofè Jọdan; ha we buso unu agha: M’we nye ha n’aka-unu, unu we nweta ala-ha; M’we kpochapu ha n’iru unu.

9 Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, we bilie buso Israel agha; o we ziga kpọ Belam nwa Beoa ikọcha unu:

10 ma ekweghm ige Belam nti; o we nāgọzi unu agọzi: M’we naputa unu n’aka-ya.

11 Unu we gabiga Jọdan, biarue Jeriko: ndi-nwe Jeriko we buso unu agha, bú ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; M’we nye ha n’aka-unu.

12 M’we ziga ebu n’iru unu, nke chupuru ha n’iru unu, bú eze abua nke ndi-Amorait; ọ bughi na mma-agha-gi, ọ bughi kwa n’uta-gi.

13 M’we nye unu ala nke i nādọb͕ughi onwe-gi n’ọlu nime ya, na obodo nke unu nēwughi, unu we biri nime ha; ubi-vine na ubi-olive nke unu nākughi ka unu nēri nkpuru-ha.

14 Ma ub͕u a, nātunu egwu Jehova, nēfè-kwa-nu Ya òfùfè n’izu-okè na ezi-okwu: wezuga-kwa-nu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè n’ofè Osimiri ahu, na n’Ijipt; ma fènu Jehova òfùfè.

15 Ma ọ buru na ọ jọ njọ n’anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n’ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n’ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.

16 Ndi Israel we za, si, Ya buru ayi ihe-árú irapu Jehova, ifè chi ọzọ òfùfè;

17 n’ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, Ya onwe-ya bu onye mere ka ayi na nna-ayi-hà si n’ala Ijipt, si n’ulo ndi-orù, rigota, Onye me-kwa-ra ihe-iriba-ama uku ahu nile n’anya-ayi, debe ayi n’uzọ ahu nile nke ayi jere ije nime ya, na n’etiti ndi nile nke ayi gabigara n’etiti ha:

18 Jehova we chupu ndi ahu nile n’iru ayi, bú ndi-Amorait ndi bi n’ala nka: ayi onwe-ayi gēfè kwa Jehova òfùfè; n’ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi.

19 Joshua we si ndi Israel, Unu apughi ifè Jehova òfùfè; n’ihi na Chineke di nsọ ka Ọ bu; Chineke ekworo ka Ọ bu; Ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu na nmehie nile unu.

20 Mb͕e unu gārapu Jehova, fè chi ala ọzọ òfùfè, Ọ gēchighari kwa mejọ unu, me ka unu gwusia, mb͕e O mesiri unu nma.

21 Ndi Israel we si Joshua, É-è; kama Jehova ka ayi gēfè òfùfè.

22 Joshua we si ndi Israel, Ndi-àmà megide onwe-unu ka unu bu, na unu onwe-unu arọputaworo onwe-unu Jehova, ifè Ya òfùfè. Ha we si, Ndi-àmà ka ayi bu.

23 Ọ si, Ma ub͕u a, wezuganu chi ala ọzọ nile nke di n’etiti unu, do-kwa-ra Jehova, bú Chineke Israel, obi-unu.

24 Ndi Israel we si Joshua, Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēfè òfùfè, olu-Ya ka ayi gēge kwa nti.

25 Joshua na ndi Israel we b͕a ndu ubọchi ahu, o we doro ha ukpuru na ikpé nime Shekem.

26 Joshua we de okwu ndia n’akwukwọ iwu Chineke; o we were nkume uku, me ka o guzo ọtọ n’ebe ahu n’okpuru osisi oak ahu nke di n’ebe nsọ Jehova.

27 Joshua we si ndi Israel nile, Le, nkume a gābu àmà megide ayi; n’ihi na ọ nuwo okwu-ọnu nile nke Jehova nke Ọ gwara ayi: ọ gābu kwa àmà megide unu, ka unu we ghara igọnari Chineke-unu.

28 Joshua we zilaga ndi Israel, nwoke ọ bula n’ihe-nketa-ya.

29 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, nwuru, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri.

30 Ha we lìe ya n’ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-sera, nke di n’ugwu Efraim, n’akuku Ugwu nke ugwu Gaash.

31 Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi ma-kwa-ra omume nile nke Jehova, nke O mere Israel.

32 Ha we lìe ọkpukpu Josef, nke umu Israel si n’Ijipt bugota, nime Shekem, n’òkè ọhia ahu nke Jekob zutara n’aka umu Hemoa nna Shekem n’ọgu nkpuru-ego ise: ha we ghọrọ umu Josef ihe-nketa.

33 Eleeza nwa Eron we nwua; ha we lìe ya n’ugwu Finehas nwa-ya, nke enyere ya n’ugwu Efraim.