Categories
JOSHUA

JOSHUA 11

1 O rue, mb͕e Jebin, bú eze Hezoa, nuru ya, na o zigara Jobab, bú eze Madon, ziga-kwa-ra eze Shimron, ziga-kwa-ra eze Akshaf,

2 ziga-kwa-ra ndi-eze ndi nọ n’Ugwu, bú n’ugwu, na n’Araba nke di na Ndida Kinerot, na n’ebe di ala ala, na n’ebe nile di elu nke Doa n’Ọdida-anyanwu, ozi;

3 o zigara ndi Kenean n’Ọwuwa-anyanwu na n’Ọdida-anyanwu, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus n’ugwu, na ndi-Haivait n’okpuru Heamon n’ala Mizpa.

4 Ha we puta, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile tiyere ha, bú ndi bara uba, dika ájá nke di n’usọ oké osimiri n’uba, ha na inyinya na ub͕ọ-ala bara uba nke-uku.

5 Eze ndia nile we zukọ; ha we bia, makọ ulo-ikwū-ha na miri Mirom, ibuso Israel agha.

6 Jehova we si Joshua, Atula egwu n’ihi ha: n’ihi na echi dika na mb͕e a Mu onwem gāra ha nile nye ka ha buru ndi eb͕uru eb͕u n’iru Israel: nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha ka i gēbipu, ọ bu kwa ub͕ọ-ala nile ha ka i gēsure n’ọku.

7 Joshua we bia, ya na ndi-agha nile, imegide ha n’akuku miri Mirom na mberede, we dakwasi ha.

8 Jehova we nye ha n’aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n’akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha.

9 Joshua we me ha dika Jehova siri ya: o bipuru nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha, sure kwa ub͕ọ-ala nile ha n’ọku.

10 Joshua we laghachi na mb͕e ahu, were Hezoa, were mma-agha tib͕ue eze-ya: n’ihi na Hezoa na mb͕e gara aga bu isi ala-eze ahu nile.

11 Ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu nile nke di nime ya, ha wezugara ha ka ebibie ha: ọ dighi onye nēku ume fọduru: o sure Hezoa n’ọku.

12 Obodo nile nke ndi-eze ahu, na eze-ha nile, ka Joshua were, o were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga ha ka ebibie ha; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu.

13 Nání, obodo nile nke Jehova nke nēguzo n’obo-ha, Israel esureghi ha ọku, nāgughi Hezoa nání ya; nke ahu ka Joshua surere ọku.

14 Ihe-nkwata nile nke obodo ndia, na anu-ulo-ha, umu Israel lutara ha n’agha nye onwe-ha; nání na ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu ọ bula, rue mb͕e ha kpochapusiri ha, ha ekweghi ka onye ọ bula nēku ume fọdu.

15 Dika Jehova nyere Moses, bú orù-Ya, iwu, otú a ka Moses nyere Joshua iwu: otú a ka Joshua me-kwa-ra; o wezugaghi okwu ọ bula n’ihe nile nke Jehova nyere Moses n’iwu.

16 Joshua we were ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb nile, na ala Goshen nile, na ebe di ala ala, na Araba, na ugwu Israel, na ebe di ala ala ya;

17 site n’ugwu Halak, nke nārigo rue Sia, we rue Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon n’okpuru ugwu Heamon: eze-ha nile ka o were, tib͕ue ha, me ka ha nwua.

18 Ọtutu ubọchi ka Joshua busoro eze ahu nile agha.

19 Ọ dighi obodo nke mere ka ha onwe-ha na umu Israel di n’udo, ma-ọbughi ndi-Haivait ndi bi na Gibeon: ha nile ka ha were n’agha.

20 N’ihi na o sitere n’aka Jehova ime ka obi-ha di ike, izute Israel n’agha, ka O we wezuga ha ka ebibie ha, ka ha we ghara inwe amara, kama ka O we kpochapu ha, dika Jehova nyere Moses iwu.

21 Joshua we bia na mb͕e ahu, bipu ndi Anak ahu n’ugwu, bú nime Hebron, na nime Debia, na n’Anab, na n’ugwu Juda nile, na n’ugwu Israel nile: ha na obodo nile ha ka Joshua wezugara ka ebibie ha.

22 Ọ dighi ndi Anak fọduru n’ala umu Israel; nání nime Geza, na nime Gat, na n’Ashdod, ka ha fọduru.

23 Joshua we were ala ahu nile, dika okwu nile si di nke Jehova gwara Moses; Joshua we nye ya Israel ka ọ buru ihe-nketa, dika esi kè ha n’òkè n’òkè dika ebo nile ha si di. Ala ahu we rapu ibu-agha, di jū.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 12

1 Ma ndia bu eze ala ahu, ndi umu Israel tib͕uru, nweta ala-ha n’ofè Jọdan n’akuku ọwuwa-anyanwu, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon, na Araba nile n’akuku ọwuwa-anyanwu:

2 Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, nāchi kwa site n’Aroea, nke di n’usọ ndagwurugwu Anon, na etiti ndagwurugwu ahu, na nkera Gilead, we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;

3 na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n’akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n’akuku ọwuwa-anyanwu, n’uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n’okpuru nkpọrube Pisga:

4 na ókè-ala Og, bú eze Beshan, onye sitere na ndi fọduru nke Refaim, onye bi n’Ashtarot na n’Edrei,

5 nāchi kwa n’ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon.

6 Moses, bú orù Jehova, na umu Israel tib͕uru ha: Moses, bú orù Jehova, we nye ya ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, ka ọ buru ihe-nnweta.

7 Ndia bu kwa eze ala ahu ndi Joshua na umu Israel tib͕uru n’ofè Jọdan n’akuku Ọdida-anyanwu, site na Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon we rue ugwu Halak, nke nārigo rue Sia; Joshua we nye ya ebo Israel nile ka ọ buru ihe-nnweta dika esi kè ha n’òkè n’òkè;

8 n’ugwu, na n’ebe di ala ala, na n’Araba ahu, na nime nkpọrube nile, na n’ọzara, na nime Negeb; ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:

9 eze Jeriko, otù; eze Ai, nke di n’akuku Bet-el, otù;

10 eze Jerusalem, otù; eze Hebron, otù:

11 eze Jamut, otù; eze Lekish, otù;

12 eze Eglon, otù; eze Gezea, otù;

13 eze Debia, otù; eze Geda, otù;

14 eze Họma, otù; eze Arad, otù;

15 eze Libna, otù; eze Adulam, otù;

16 eze Makeda, otù; eze Bet-el, otù;

17 eze Tapua, otù; eze Hefa, otù;

18 eze Efek, otù; eze Lasharon, otù;

19 eze Madon, otù; eze Hezoa, otù;

20 eze Shimron-meron, otù; eze Akshaf, otù;

21 eze Teanak, otù; eze Megido, otù;

22 eze Kedesh, otù; eze Jọkneam nime Kamel, otù;

23 eze Doa n’ebe di elu nke Doa, otù; eze Goim nime Gilgal, otù;

24 eze Tiaza, otù: eze ahu nile di orú na iri na otù.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 13

1 Ma Joshua ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; Jehova we si ya, I ghọwo agadi, ubọchi ndu-gi nāgwu, ma ala nke riri nne nke-uku fọduru inweta.

2 Nka bu ala nke fọduru: buruburu-ala nile nke ndi Filistia, na ndi Geshua nile;

3 site na Shaihoa ahu, nke di n’iru Ijipt, we rue ókè-ala Ekron n’akuku Ugwu, ndi Kenean ka aguru ya nye: ndi-isi ise nke ndi Filistia; ndi Geza, na ndi Ashdod, na ndi Ashkelon, na ndi Gat, na ndi Ekron; ndi Avim kwa,

4 site na Ndida: ala nile nke ndi Kenean, na Meara nke ndi Zaidon nwe, rue Efek, rue ókè-ala ndi-Amorait:

5 na ala ndi Gebal, na Lebanon nile, n’ọwuwa-anyanwu, site na Beal-gad n’okpuru ugwu Heamon rue nbata Hemat:

6 ndi nile bi n’ugwu site na Lebanon rue Mizrefot-maim, bú ndi Zaidon nile; Mu onwem nānapu ha ala-ha n’iru umu Israel: nání me ka ọ dayere Israel n’ihe-nketa, dika M’nyeworo gi iwu.

7 Ma ub͕u a kère ebo iteghete na nkera ebo Manase ala nka n’ihe-nketa.

8 Ndi Reuben na ndi Gad soro ya nara ihe-nketa-ha, nke Moses nyere ha, n’ofè Jọdan n’akuku ọwuwa-anyanwu, dika Moses, bú orù Jehova, nyere ha;

9 site n’Aroea, nke di n’usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n’etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke Medeba rue Dibon;

10 na obodo nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, rue ókè-ala umu Amon;

11 na Gilead, na ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na ugwu Heamon nile, na Beshan nile rue Saleka;

12 ala-eze nile nke Og nime Beshan, onye buri eze n’Ashtarot na n’Edrei (onye ahu fọduru site na ndi fọduru nke Refaim); Moses we tib͕ue ha, napu ha ala-ha.

13 Ma umu Israel anapughi ndi Geshua na ndi Meakat ala-ha: Geshua na Meakat we biri n’etiti umu Israel, rue ta.

14 Nání ebo Livai ka ọ nēnyeghi ihe-nketa; àjà-ọku nile nke Jehova, bú Chineke Israel, nke ahu bu ihe-nketa-ya, dika Ọ gwara ya okwu.

15 Moses we nye ebo umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di.

16 Ókè-ala ha nwere we di site n’Aroea, nke di n’usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n’etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke di n’akuku Medeba;

17 Heshbon, na obodo-ya nile nke di n’ala di lari; Dibon, na Bamot-beal, na Bet-beal-meon;

18 na Jehaz, na Kedimot, na Mefaat;

19 na Kiriataim, na Sibma, na Zeret-shaha n’ugwu ndagwurugwu ahu;

20 na Bet-peoa, na nkpọrube nile nke Pisga, na Bet-jeshimot;

21 na obodo nile nke ala di lari, na ala-eze nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, onye Moses tib͕uru, ya na ndi-isi Midian, bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, ndi bu ndi-isi nke Saihon, ndi bi n’ala ahu.

22 Umu Israel were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa, bu onye nāju ase, n’etiti ndi ha b͕uru.

23 Òkè-ala umu Reuben we buru Jọdan, na ókè-ala-ya. Nka bu ihe-nketa umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà nile ha.

24 Moses we nye ebo Gad, bú umu Gad, dika ab͕uru nile ha si di.

25 Ókè-ala-ha we buru Jeza, na obodo nile nke Gilead, na nkera ala umu Amon, rue Aroea nke di n’iru Raba;

26 site kwa na Heshbon rue Remat-mizpe, na Betonim; site kwa na Mahanaim rue ókè-ala Debia;

27 na nime ndagwurugwu ahu, Bet-heram, na Bet-nimra, na Sukot, na Zafon, bú nke fọduru nke ala-eze Saihon, bú eze Heshbon, Jọdan na ókè-ala-ya, rue nsọtu oké osimiri Kineret n’ofè Jọdan n’akuku ọwuwa-anyanwu.

28 Nka bu ihe-nketa umu Gad dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà nile ha.

29 Moses we nye nkera ebo Manase ihe-nketa: ọ we diri nkera ebo umu Manase dika ab͕uru nile ha si di.

30 Ókè-ala-ya we di site na Mahanaim, Beshan nile, ala-eze nile nke Og, bú eze Beshan, na ebe-obibi nile nke Jaia, nke di na Beshan, ọgu obodo atọ:

31 nkera Gilead, na Ashtarot, na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan, we diri umu Makia nwa Manase, diri nkera umu Makia dika ab͕uru nile ha si di.

32 Ndia bu ndi Moses mere ka ha keta ihe n’ala ihe nādighi nke Moab, n’ofè Jọdan n’akuku Jeriko, n’akuku ọwuwa-anyanwu.

33 Ma Moses enyeghi ebo Livai ihe-nketa: Jehova, bú Chineke Israel, bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwara ha okwu.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 14

1 Ma ndi bu ihe nke umu Israel ketara n’ala Kenean, ndi Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel, mere ka ha keta;

2 n’ifè-nzà ka ihe-nketa-ha di, dika Jehova nyere iwu n’aka Moses, bayere ebo iteghete ahu, baye-kwa-ra nkera ebo ahu.

3 N’ihi na Moses nyere ihe-nketa nke ebo abua na nkera ebo ahu n’ofè Jọdan: ma o nyeghi ndi Livai ihe-nketa n’etiti ha.

4 N’ihi na umu Josef bu ebo abua, bú Manase na Efraim: ha enyeghi kwa ndi Livai òkè n’ala ahu, ma-ọbughi obodo ufọdu ibi obi, ha na ebe-ita-nri-ha nke diri anu-ulo-ha na àkù ha kpatara.

5 Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu Israel mere, ha we kè ala ahu.

6 Umu Juda we biarue nso Joshua nime Gilgal: Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, we si ya, Gi onwe-gi amawo okwu Jehova gwara Moses, bú onye nke Chineke, bayerem, baye-kwa-ra gi, nime Kedesh-banea.

7 Ọgu arọ abua ka m’b͕ara mb͕e Moses, bú orù Jehova, si na Kedesh-banea zipum iledo ala nka; m’we weghachiri ya okwu dika o si di n’obim.

8 Ma umu-nnem ndi mu na ha rigoro mereka obi lọ ndi Israel miri: ma mu onwem sozuru Jehova, bú Chinekem, n’azu.

9 Moses we ṅua iyi n’ubọchi ahu, si, Ala nke i zọkwasiri ukwu aghaghi iburu gi na umu-gi ihe-nketa rue mb͕e ebighi-ebi, n’ihi na i sozuwo Jehova, bú Chinekem, n’azu.

10 Ma ub͕u a, le, Jehova emewo ka m’di ndu, dika O kwuru, ọgu arọ abua na ise ndia, site na mb͕e Jehova gwara Moses okwu a, mb͕e Israel jere ije n’ọzara: ma ub͕u a, le, mu onwem b͕ara ọgu arọ anọ na ise ta.

11 Rue ub͕u a m’di ike ta dika m’di n’ubọchi Moses zigaram: dika ikem si di mb͕e ahu, otú a ka ikem di kwa ub͕u a, ibu agha, na ipu apu, na ibata abata.

12 Ma ub͕u a, nyem ugwu a, nke Jehova kwuru okwu bayere ya n’ubọchi ahu; n’ihi na i nuru n’ubọchi ahu na ndi Anak nọ n’ebe ahu, na obodo di uku nke ewusiri ike: eleghi anya Jehova gānọyerem, m’gānapu kwa ha ala-ha, dika Jehova kwuru.

13 Joshua we gọzie ya; ọ we nye Keleb nwa Jefune Hebron ibu ihe-nketa.

14 N’ihi nka Hebron we ghọrọ Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, ihe-nketa, rue ta; n’ihi na o sozuru Jehova, bú Chineke Israel, n’azu.

15 Ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba; onye dikarisiri uku n’etiti ndi Anak ka Aba ahu bu. Ala ahụ we rapu ibu agha, di jū.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 15

1 Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n’akuku Ndida, na nsọtu Ndida.

2 Ókè-ala Ndida nke ha nwere we di site na nsọtu Oké Osimiri Nnú, site n’ọnu-miri nke nēche iru na Ndida:

3 o we pua rue akuku Ndida nke nrigo Akrabim, gabiga rue Zin, rigo n’akuku Ndida nke Kedesh-banea, gabiga Hezron, rigorue Ada, b͕a buruburu rue Kaka:

4 o we gabiga rue Azmon, pua na miri-iyi Ijipt; ọpupu ókè-ala ahu we di n’oké osimiri: nka gāburu unu ókè-ala Ndida.

5 Ókè-ala ọwuwa-anyanwu we buru Oké Osimiri Nnú, rue nsọtu Jọdan. Ókè-ala akuku Ugwu we site n’ọnu-miri nke oké osimiri ahu na nsọtu Jọdan:

6 ókè-ala ahu we rigo rue Bet-họgla, gabiga n’akuku Ugwu nke Bet-araba; ókè-ala ahu we rigo rue nkume Bohan nwa Reuben:

7 ókè-ala ahu we rigo rue Debia site na ndagwurugwu Ekoa, ga n’akuku Ugwu, nēche Gilgal iru, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim, nke di n’akuku Ndida nke miri-iyi ahu: ókè-ala ahu we gabiga rue miri En-shemesh, ọpupu-ya we dirue En-rogel:

8 ókè-ala ahu we rigo na ndagwurugwu nwa Hinom rue akuku ndi Jebus n’akuku Ndida (ndida ahu bu Jerusalem): ókè-ala ahu we rigo rue elu ugwu ahu nke di n’iru ndagwurugwu Hinom n’akuku Ọdida-anyanwu, nke di na nsọtu ndagwurugwu Refaim n’akuku Ugwu:

9 ewe kpa ókè-ala ahu site n’elu ugwu rue isi-iyi miri Neftoa, ọ we pua rue obodo nile nke ugwu Efron; ewe kpa ókè-ala ahu rue Beala (nke ahu bu Kiriat-jearim):

10 ókè-ala ahu we b͕a buruburu site na Beala ga n’akuku Ọdida-anyanwu, rue ugwu Sia, we gabiga rue akuku ugwu Jearim n’Ugwu (nke ahu bu Kesalon), rida rue Bet-shemesh, gabiga Timna:

11 ókè-ala ahu we pua rue akuku Ekron n’akuku Ugwu: ewe kpa ókè-ala ahu rue Shikeron, o we gabiga rue ugwu Beala, we pua na Jabneel; ọpupu ókè-ala ahu di n’oké osimiri.

12 Ókè-ala Ọdida-anyanwu we di rue oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya. Nka bu ókè-ala umu Juda buruburu, dika ab͕uru nile ha si di.

13 Ọ nye-kwa-ra Keleb Jefune òkè n’etiti umu Juda, dika okwu-ọnu Jehova gwara Joshua si di, bú Kiriat-aba; Aba bu nna Anak (nke ahu bu Hebron).

14 Keleb we si n’ebe ahu napu umu-ndikom Anak atọ, bú Sheshai, na Ahiman, na Talmai, umu Anak, ala-ha.

15 Ọ we si n’ebe ahu rigo imegide ndi bi na Debia: ma aha Debia na mb͕e gara aga bu Kiriat-sefa.

16 Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m’gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye.

17 Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye.

18 O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n’aka nna-ya: Aksa si n’inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ?

19 Ọ si, Nyem ngọzi; n’ihi na ọ bu ala Negeb ka i nyeworom, nyekwam isi miri ufọdu. Ọ we nye ya isi miri di n’elu, na isi miri di n’okpuru.

20 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di.

21 Obodo nke di na nsọtu ebo umu Juda nwere n’akuku ókè-ala Edom nime Negeb bu Kabzeel, na Ida, na Jagua;

22 na Kina, na Dimona, na Adada;

23 na Kedesh, na Hezoa, na Itnan;

24 na Zif, na Telem, na Bealot;

25 na Hezoa-hadata, na Keriot-hezron (nke ahu bu Hezoa);

26 na Amam, na Shema, na Molada;

27 na Haza-gada, na Heshmon, na Bet-pelet;

28 na Haza-shual, na Bia-sheba, na Biziotia;

29 na Beala, na Iyim, na Ezem;

30 na Eltolad, na Kesil, na Họma;

31 na Ziklag, na Madmana, na Sansana;

32 na Lebaot, na Shilhim, na Ain, na Rimon: obodo nile di orú na iteghete, ha na obodo ntà ha.

33 N’ebe di ala ala, Eshtaol, na Zọra, na Ashna;

34 na Zanoa, na En-ganim, na Tapua, na Inam;

35 na Jamut, na Adulam, na Soko, na Azeba;

36 na Shaaraim, na Aditaim, na Gedira, na Gedirotaim; obodo iri na anọ na obodo ntà ha.

37 Zenan, na Hadasha, na Migdal-gad;

38 na Dilan, na Mizpe, na Jọkteel;

39 na Lekish, na Bọzkat, na Eglon;

40 na Kabon, na Lahmam, na Kitlish;

41 na Gedirot, na Bet-degon, na Neama, na Makeda; obodo iri na isi na obodo ntà ha.

42 Libna, na Eta, na Ashan;

43 na Ifta, na Ashna, na Nezib;

44 na Keila, na Akzib, na Marisha; obodo iteghete na obodo ntà ha.

45 Ekron, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile:

46 site n’Ekron we rue oké osimiri, obodo nile nke di n’akuku Ashdod, na obodo ntà ha.

47 Ashdod, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; Geza, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; rue miri-iyi Ijipt, na oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya.

48 N’ugwu kwa, Shamia, na Jatia, na Soko;

49 na Dana, na Kiriat-sana (nke ahu bu Debia);

50 na Anab, na Eshtemo, na Anim;

51 na Goshen, na Holon, na Gailo; obodo iri na otù na obodo ntà ha.

52 Arab, na Duma, na Eshan;

53 na Janim, na Bet-tapua, na Afika;

54 na Humta, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), na Zioa; obodo iteghete na obodo ntà ha.

55 Maon, na Kamel, na Zif, na Juta;

56 na Jesreel; na Jokdeam, na Zanoa;

57 na Kain, na Gibea, na Timna; obodo iri na obodo ntà ha.

58 Halhul, na Bet-zua, na Gedoa;

59 na Maarat, na Bet-anot, na Eltekon; obodo isi na obdo ntà ha.

60 Kiriat-beal (nke ahu bu Kiriat-jearim), na Raba; obodo abua na obodo ntà ha.

61 N’ọzara, Bet-araba, na Midin, na Sekaka;

62 na Nibshan, na Obodo Nnú, na En-gedi; obodo isi na obodo ntà ha.

63 Ma ndi Jebus, ndi bi na Jerusalem, umu Juda apughi inapu ha ala-ha: ndi Jebus we biri n’etiti umu Juda nime Jerusalem, rue ta.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 16

1 Ife-nzà nke mara umu Josef siri na Jọdan pua Jeriko, na miri Jeriko n’ọwuwa-anyanwu, bú ọzara ahu, nēsi na Jeriko rigo n’ugwu rue Bet-el;

2 o si na Bet-el pua rue Luz, gabiga rue ókè-ala ndi-Akait rue Atarot;

3 ọ rida n’akuku Ọdida-anyanwu rue ókè-ala ndi-Jafletait, rue ókè-ala Bet-horon di n’okpuru, rue Gezea: ọpupu-ya we di n’oké osimiri.

4 Umu Josef, bú Manase na Efraim, we keta nke ha.

5 Ókè-ala umu Efraim, dika ab͕uru nile ha si di, we di otú a: ókè-ala nke ihe-nketa-ha n’akuku ọwuwa-anyanwu bu Atarot-ada, rue Bet-horon di n’elu;

6 ókè-ala ahu we pua n’akuku Ọdida-anyanwu na Mikmetat n’Ugwu; ókè-ala ahu we b͕a buruburu n’akuku ọwuwa-anyanwu, rue Taanat-shailo, we gabiga ya n’akuku ọwuwa-anyanwu Janoa;

7 o si na Janoa rida rue Atarot, ru kwa Naarah, metu Jeriko, we pua na Jọdan.

8 Ókè-ala ahu siri na Tapua je n’akuku Ọdida-anyanwu rue miri-iyi Kena; ọpupu-ya we di n’oké osimiri. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Efraim dika ab͕uru nile ha si di;

9 tiyere obodo nile akpaputara umu Efraim n’etiti ihe-nketa nke umu Manase, obodo ahu nile na obodo ntà nile ha.

10 Ma ha anapughi ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha: ndi Kenean we biri n’etiti Efraim, rue ta, ghọ ndi nēfè òfùfè orù.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 17

1 Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n’ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n’ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.

2 Ife-nzà di kwa nke mara umu Manase fọduru dika ab͕uru nile ha si di; ọ diri umu Abieza, di-kwa-ra umu Hilek, di-kwa-ra umu Asriel, di-kwa-ra umu Shekem, di-kwa-ra umu Hifa, di-kwa-ra umu Shemida: ndia bu umu-ndikom Manase nwa Josef dika ab͕uru nile ha si di.

3 Ma Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: ndia bu kwa aha umu-ya ndinyom, Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.

4 Ha we biarue nso n’iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n’iru Joshua nwa Nun, na n’iru ndi-isi, si, Jehova nyere Moses iwu inye ayi ihe-nketa n’etiti umu-nne-ayi: o we nye ha ihe-nketa n’etiti umu-nne nna-ha dika okwu-ọnu Jehova si di.

5 Òkè iri we dabara Manase, nāgughi ala Gilead na Beshan, nke di n’ofè Jọdan;

6 n’ihi na umu-ndinyom Manase ketara ihe-nketa n’etiti umu-ya ndikom: ala Gilead kwa, umu-ndikom Manase fọduru nwere ya.

7 Ókè-ala Manase we si n’Asha rue Mikmetat, nke di n’iru Shekem; ókè-ala ahu we je rue aka-nri, rue ndi bi n’En-tapua.

8 Manase nwe ala Tapua: ma umu Efraim nwe Tapua rue ókè-ala Manase.

9 Ókè-ala ahu we rida rue miri-iyi Kena, n’akuku Ndida nke miri-iyi ahu: obodo ndia ka Efraim nwere n’etiti obodo Manase: ókè-ala Manase we di n’akuku Ugwu miri-iyi ahu, ọpupu-ya we di n’oké osimiri:

10 n’akuku Ndida ọ diri Efraim, ma n’akuku Ugwu ọ diri Manase, oké osimiri bu kwa ókè-ala-ya; ha we metu Asha n’Ugwu, metu kwa Isaka n’ọwuwa-anyanwu.

11 Manase nwekwara obodo n’Isaka na n’Asha, bú Bet-shean na umu-obodo-ya, na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na En-doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, bú ebe di elu atọ ahu.

12 Ma umu Manase apughi inapu ndi bi n’obodo ahu ala-ha; ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n’ala ahu.

13 O rue, mb͕e umu Israel di ike, na ha tiyere ndi Kenean n’ifè-òfùfè, ma ha anapusighi ha ala-ha.

14 Umu Josef we gwa Joshua okwu, si, Gini mere i nyeworom otù ihe-ife-nzà na otù òkè n’ihe-nketa; ma mu onwem bu ndi bara uba, n’ihi na Jehova agọziwom rue ub͕u a?

15 Joshua we si ha, Ọ buru ndi bara uba ka i bu, rigorue oké ọhia n’onwe-gi, b͕utu-kwa-ra onwe-gi n’ebe ahu n’ala ndi-Perizait na Refaim; ebe ugwu Efraim diri gi nkpa.

16 Umu Josef we si, Ugwu a ezughi ayi: ma ub͕ọ-ala ígwè di n’aka ndi Kenean nile ndi bi n’ala ndagwurugwu, ma ndi bi na Bet-shean na umu-obodo-ya, ma ndi bi na Jezreel.

17 Joshua we gwa ulo Josef, bú Efraim na Manase, okwu, si, Ndi bara uba ka i bu, ọ bu kwa ike uku ka i nwere: i gaghi-enwe nání otù ihe-ife-nzà:

18 n’ihi na ugwu ahu ka i gēnwe; n’ihi na oké ọhia ka ọ bu, i gēb͕utu kwa ya, i gēnwe kwa ọpupu-ya nile: n’ihi na i gānapu ndi Kenean ala-ha, ọ bu ezie na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè, ọ bu kwa ezie na ndi di ike ka ha bu.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 18

1 Nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha na Shailo, ma ulo-ikwū nzute n’ebe ahu: ewe buda ala ahu n’iru ha.

2 Ebo asa we fọdu n’etiti umu Israel, ndi anēkeghi ihe-nketa-ha.

3 Joshua we si umu Israel, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu gābu ndi-ume-ngwu ibà inweta ala ahu, nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nyeworo unu?

4 Doronu onwe-unu ndikom atọ inọrọ ebo ọ bula: m’gēziga kwa ha, ha gēbili kwa, jegharia n’ala nka, de ya n’akwukwọ dika ihe-nketa-ha si di; ha gābiakutekwam.

5 Ha gēkè kwa ya òkè asa: Juda gēguzo n’ókè-ala-ya na Ndida, ulo Josef gēguzo kwa n’ókè-ala-ha n’Ugwu.

6 Unu onwe-unu gēde kwa ala ahu n’akwukwọ n’òkè asa, wetaram akwukwọ ahu n’ebe a: m’gēfe-kwa-ra unu nzà n’ebe a n’iru Jehova, bú Chineke-ayi.

7 N’ihi na ndi Livai enweghi òkè n’etiti unu; n’ihi na ọlu-nchu-àjà Jehova bu ihe-nketa-ha: Gad na Reuben na nkera ebo Manase anarawo kwa ihe-nketa-ha n’ofè Jọdan n’akuku ọwuwa-anyanwu, nke Moses, bú orù Jehova nyere ha.

8 Ndikom ahu we bilie, je: Joshua we nye ndi nēje ide ala ahu n’akwukwọ iwu, si, Jenu, jegharia n’ala nka, de ya n’akwukwọ, laghachikutem, m’gēfe-kwa-ra unu nzà n’ebe a n’iru Jehova, nime Shailo.

9 Ndikom ahu we je, gabiga n’ala ahu, de ya n’akwukwọ dika obodo nile si di n’òkè asa, ha we biakute Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū nime Shailo.

10 Joshua we fere ha nzà nime Shailo n’iru Jehova: Joshua we kère umu Israel ala n’ebe ahu dika esi kè ha n’òkè n’òkè.

11 Ife-nzà nke ebo umu Benjamin we puta dika ab͕uru nile ha si di; ókè-ala nke ihe-ife-nzà-ha we puta n’etiti umu Juda na umu Josef.

12 Ókè-ala ha nwere n’akuku Ugwu we site na Jọdan; ókè-ala ahu we rigo rue akuku Jeriko n’Ugwu, rigo kwa n’ugwu n’akuku Ọdida-anyanwu; ọpupu-ya di kwa n’ọzara Bet-even.

13 Ókè-ala ahu we si n’ebe ahu gabiga rue Luz, rue akuku Luz (nke ahu bu Bet-el), n’akuku Ndida; ókè-ala ahu we rida rue Atarot-ada, n’elu ugwu nke di na Ndida nke Bet-horon di n’okpuru.

14 Ewe kpa ókè ahu, o we b͕a buruburu rue akuku Ọdida-anyanwu n’akuku Ndida, site n’ugwu nke di n’iru Bet-horon n’akuku Ndida; ọpupu-ya di kwa na Kiriat-beal (nke ahu bu Kiriat-jearim), bú obodo umu Juda: nka bu akuku Ọdida-anyanwu.

15 Akuku Ndida we site na nsọtu Kiriat-jearim, ókè-ala ahu we pua n’akuku Ọdida-anyanwu, pua rue isi-iyi miri Neftoa:

16 ókè-ala ahu we rida rue nsọtu ugwu ahu nke di n’iru ndagwurugwu nwa Hinom, nke di na ndagwurugwu Refaim n’akuku Ugwu; ọ rida rue ndagwurugwu Hinom, rue akuku ndi Jebus n’akuku Ndida, we rida rue En-rogel;

17 ewe kpa ókè-ala ahu n’Ugwu, ọ pua n’En-shemesh, pu kwa rue Gelilot, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim; ọ rida rue nkume Bohan nwa Reuben;

18 ọ gabiga rue akuku na ncherita-iru Araba n’akuku Ugwu, we rida rue Araba:

19 ókè-ala ahu we gabiga rue akuku Bet-họgla n’akuku Ugwu: ọpupu ókè-ala ahu di kwa n’ọnu-miri Ugwu nke Oké Osimiri Nnú, na nsọtu Ndida nke Jọdan; nka bu ókè-ala Ndida.

20 Jọdan bu kwa ókè-ala-ya n’akuku Iru-anyanwu. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu dika ab͕uru nile ha si di.

21 Ma obodo ebo umu Benjamin nwere dika ab͕uru nile ha si di bu Jeriko, na Bet-họgla, na Emek-keziz;

22 na Bet-araba, na Zemaraim, na Bet-el;

23 na Avim, na Para, na Ọfra;

24 na Kefa-amoni, na Ọfni, na Geba; obodo iri na abua na obodo ntà ha:

25 na Gibeon, na Rema, na Beirot;

26 na Mizpeh, na Kefira, na Moza;

27 na Rekem, na Iapeel, na Tarala;

28 na Zela, na Elef, na ndi Jebus (nke ahu bu Jerusalem), na Gibeat, na Kiriat; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin dika ab͕uru nile ha si di.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 19

1 Ife-nzà nke-abua we putara Simeon, bú ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di: ihe-nketa-ha di n’etiti ihe-nketa umu Juda.

2 Ha we nwe n’ihe-nketa-ha Bia-sheba, ma-ọbu Sheba, na Molada;

3 na Haza-shual, na Bala, na Ezem;

4 na Eltolad, na Betul, na Họma;

5 na Ziklag, na Bet-makabot, na Haza-susa;

6 na Bet-lebaot, na Sharuhen; obodo iri na atọ na obodo ntà ha:

7 na Ain, na Rimon, na Eta, na Ashan; obodo anọ na obodo ntà ha:

8 na obodo ntà nile nke di obodo ndia buruburu rue Bealat-bia, bú Rema nke Negeb. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di.

9 Site n’òkè umu Juda ka ihe-nketa umu Simeon di: n’ihi na òkè umu Juda riri nne kari ha: umu Simeon we keta ihe n’etiti ihe-nketa-ha.

10 Ife-nzà nke-atọ we putara umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di: ókè-ala ihe-nketa-ha we di rue Sarid:

11 ókè-ala-ha we rigo n’akuku Ọdida-anyanwu, ru kwa Marala, we metu Dabeshet, metu kwa miri-iyi nke di n’iru Jọkneam;

12 o si na Sarid chigharia n’akuku Iru-anyanwu n’ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa; ọ pua rue Daberat, we rigo rue Jafia;

13 o si n’ebe ahu gabiga n’akuku Iru-anyanwu n’akuku ọwuwa-anyanwu rue Gat-hefa, rue Et-kazin; ọ pua na Rimon, nke akpara rue Nea;

14 ókè-ala ahu we b͕a ya buruburu n’Ugwu rue Hanaton: ọpupu-ya di kwa na ndagwurugwu Ifta-el;

15 na Katat, na Nahalal, na Shimron, na Idala, na Bet-lehem: obodo iri na abua na obodo ntà ha.

16 Nka bu ihe-nketa umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.

17 Ife-nzà nke-anọ we putara Isaka, bú umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di.

18 Ókè-ala-ha we rue Jezreel, na Kesulot, na Shunem;

19 na Hafaraim, na Shion, na Anaharat;

20 na Rabit, na Kishion, na Ebez;

21 na Remet, na En-ganim, na En-hada, na Bet-pazez:

22 ókè-ala ahu we metu Teboa, na Shahazuma, na Bet-shemesh; ọpupu ókè-ala-ha di kwa na Jọdan: obodo iri na isi na obodo ntà ha.

23 Nka bu ihe-nketa ebo umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di, obodo ahu na obodo ntà ha.

24 Ife-nzà nke-ise we putara ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di.

25 Ókè-ala-ha we buru Helkat, na Hali, na Beten, na Akshaf;

26 na Alamelek, na Amad, na Mishal; ọ metu Kamel n’akuku Ọdida-anyanwu, metu kwa Shaihoa-libnat;

27 ọ we chigharia n’ọwuwa-anyanwu rue Bet-degon, we metu Zebulun, metu kwa ndagwurugwu Ifta-el n’akuku Ugwu rue Bet-emek na Neiel; ọ pua rue Kabul n’aka-ekpe,

28 na Ebron, na Rehob, na Hamon, na Kena, we rue Zaidon bara uba;

29 ókè-ala ahu we chigharia rue Rema, ru kwa obodo ahu ewusiri ike, bú Taia; ókè-ala ahu we chigharia rue Hosa; ọpupu-ya di kwa n’oké osimiri site na Hebel rue Akzib:

30 na Uma, na Efek, na Rehob: orú obodo na abua na obodo ntà ha.

31 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.

32 Ọ bu umu Naftali ka ife-nzà nke-isi putara, bú umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di.

33 Ókè-ala-ha we site na Helef, site n’osisi terebinth nime Zaananim, na Adami-nekeb, na Jabneel, rue Lakum; ọpupu-ya we di na Jọdan:

34 ókè-ala ahu we chigharia n’akuku Ọdida-anyanwu rue Aznot-teboa, si n’ebe ahu pua rue Hukok; ọ metu Zebulun na Ndida, metu kwa Asha n’Ọdida-anyanwu, metu kwa Juda n’akuku Jọdan n’ọwuwa-anyanwu.

35 Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hamat, na Rakat, na Kineret;

36 na Adama, na Rema, na Hezoa;

37 na Kedesh, na Edrei, na En-hezoa;

38 na Iron, na Migdal-el, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; obodo iri na iteghete na obodo ntà ha.

39 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha.

40 Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara.

41 Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh;

42 na Shaalabin na Ajalon, na Itla;

43 na Ilon, na Timna, na Ekron;

44 na Elteke, na Gibeton, na Bealat;

45 na Jihud, na Bene-berak, na Gat-rimon;

46 na Me-jakon, na Rakon, tiyere ókè-ala di na ncherita-iru Jafo.

47 Ókè-ala umu Dan we si n’ebe ha nọ pua: umu Dan we rigo, buso Leshem agha, were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, ha we nweta ya, biri nime ya, we kpọ Leshem, Dan, dika aha Dan, bú nna-ha, si di.

48 Nka bu ihe-nketa ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.

49 Ha we mesia ka eketa ala ahu dika ókè-ala-ya nile si di; umu Israel we nye Joshua nwa Nun ihe-nketa n’etiti ha:

50 n’okwu-ọnu Jehova ka ha nyere ya obodo ahu nke ọ riọrọ, bú Timnat-sera n’ugwu Efraim: o wue obodo ahu, biri nime ya.

51 Ndia bu ihe-nketa, nke Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo ndi bu nna ebo umu Israel, mere ka eketa n’ife-nzà nime Shailo n’iru Jehova, n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. Ha we kebìe ala ahu.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 20

1 Jehova we gwa Joshua okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, si, Wezugara onwe-unu obodo nb͕abà ahu, nke M’gwara unu okwu bayere ha n’aka Moses:

3 ka ob͕u-madu onye nētib͕u madu n’ọghọm nāmaghi ama we b͕alaga n’ebe ahu: ha gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà ipu n’aka onye-ọ́bọ̀ ọbara.

4 Ọ gāb͕alaga kwa n’otù nime obodo ahu, guzo n’oghere ọnu-uzọ-ama obodo ahu, kwue okwu-ya nile na nti ndi-okenye obodo ahu; ha gākpọbata kwa ya n’obodo tiyere onwe-ha, nye ya ọnọdu, ka o we biri n’etiti ha.

5 Ma mb͕e onye-ọ́bọ̀ ọbara gāchu ya n’azu, ha agaghi ekwe ka ob͕u-madu ahu ba n’aka-ya; n’ihi na ọ bu n’amaghi-ama ka o tib͕uru madu-ibe-ya, ma ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.

6 O gēbi kwa n’obodo ahu, rue mb͕e o gēguzo n’iru nzukọ Israel ka ekpe ya ikpe, rue ọnwu onye-isi-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu: mb͕e ahu ob͕u-madu ahu gālaghachi, ba n’obodo-ya, ba kwa n’ulo-ya, rue obodo ahu nke o si n’ebe ahu b͕alaga.

7 Ha we do obodo ndia nsọ, bú Kedesh nime Galili, n’ugwu Naftali, na Shekem n’ugwu Efraim, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron) n’ugwu Juda.

8 N’ofè Jọdan n’akuku Jeriko n’akuku ọwuwa-anyanwu ha nye-kwa-ra Beza n’ọzara n’ala di lari site n’ebo Reuben, na Remot nime Gilead site n’ebo Gad, na Golan nime Beshan site n’ebo Manase.

9 Ndia bu obodo akara àkà bayere umu Israel nile, baye-kwa-ra ọbìa nke nānọ dika ọbìa n’etiti ha, ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n’ọghọm we b͕alaga n’ebe ahu, ghara kwa onwu n’aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, rue mb͕e ọ gēguzo n’iru nzukọ Israel.