Categories
JONA

JONA 1

1 Okwu Jehova we rue Jona nwa Amitai nti, si,

2 Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku, ahu, kpọsa okwu megide ya; n’ihi na ihe ọjọ ha arigotawo n’irum.

3 Jona we bilie isi n’iru Jehova b͕alaga na Tashish, o we rida na Jafo, chọta ub͕ọ nke nēje Tashish: ọ we tua ùtú-ya, ba nime ya, iso ha biarue Tashish ipu n’iru Jehova.

4 Ma Jehova tubàra ifufe di uku n’oké osimiri, oke ifufe di uku we di n’oké osimiri, ewe chè na ub͕ọ gētiwa.

5 Ndi-ub͕ọ we tua egwu, we tikue, onye ọ bula chi-ya; ha we tufue ihe nile nke di n’ub͕ọ n’oké osimiri, ime ka ọ di kari nfe n’aru ha. Ma Jona ridarari n’ime-ime-ala ub͕ọ; o we dina ala, da n’oké ura.

6 Onye-isi nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ we biakute ya nso, si ya, Gini nēme gi, gi onye oké ura? bilie, kpọkue Chineke-gi, eleghi anya Chineke gēcheta ayi, ayi we ghara ila n’iyì.

7 Ha we sirita ibe-ha n’otù n’otù, Bianu, ka ayi fe nzà, ka ayi we mara n’ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru. Ha we fe nzà nzà we ma Jona.

8 Ha we si ya, Biko, gosi ayi n’ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru; òle ozi i nēje? ọ̀ bu kwa ole ebe i si bia? òle ala-gi? òle ndi i siri nime ha puta?

9 O we si ha, Onye-Hibru ka m’bu; ọ bu kwa Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, ka m’nātu egwu Ya, bú Onye mere oké osimiri na ala-akọrọ.

10 Ndikom ahu we tua oké egwu, si ya, Gini bu ihe a i meworo? N’ihi na ndikom ahu mara na ọ bu n’iru Jehova ka ọ nēsi b͕alaga, n’ihi na o gosiri ha-ri.

11 Ha we si ya, Gini ka ayi gēme gi, ka oké osimiri we dajua ghara imakwasi ayi? n’ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu.

12 O we si ha, Bulienum, tubàm n’oké osimiri; oké osimiri ewe dajua ghara imakwasi unu: n’ihi na mu onwem amawo na ọ bu n’ihim ka oké ifufe di uku a nēfekwasi unu.

13 Ma ndikom ahu we nyasie ike inyaghachi ub͕ọ n’ala; ma ha apugh: n’ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu megide ha.

14 Ha we kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, biko, ekwela ka ayi la n’iyì n’ihi ndu nwoke a, etiyekwasi-kwa-la n’isi ayi ọbara nēmeghi ihe ọjọ: n’ihi na Gi onwe-gi, bú Jehova, emewo dika o si tọ Gi.

15 Ha we bulie Jona, tubà ya n’oké osimiri: oké osimiri we guzo ọb͕ub͕ọ-ya.

16 Ndikom ahu we tua egwu Jehova nke-uku, ha we chuara Jehova àjà, kwe nkwa di iche iche.

17 Jehova we guputa otù azù uku ilo Jona; Jona we nọ n’afọ azù ahu ubọchi atọ ehihie na abali.

Categories
JONA

JONA 2

1 Jona we si n’afọ azù ahu kpere Jehova, bú Chineke-ya, ekpere.

2 O we si,

Esirim n’ahuhum kpọkue Jehova,

O we zam;

N’afọ ala-mọ ka m’siri tikue Ya,

I nuru olum.

3 N’ihi na I tubàram nime miri di omimi, n’etiti oké osimiri nile,

Osimiri dikwam buruburu;

Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile gabigara n’isim.

4 Mu onwem we si, Achupuwom n’iru anya-Gi abua;

Otú ọ di, m’gēlegide kwa anya ọzọ n’ebe ulo uku Gi di nsọ di.

5 Miri b͕aram buruburu, rue nkpuru-obi;

Ob͕u-miri dim buruburu;

Achara-miri kukurum n’isi.

6 Rue ala ugwu nile ka m’ridara;

Ala, ihe-ntuchi-ya nile kpachitaram rue mb͕e ebighi-ebi:

Ma I mewo ka ndum si n’olùlù rigoputa, Jehova, bú Chinekem.

7 Mb͕e nkpuru-obim nēnweghi ike nimem, Jehova ka m’chetara:

Ekperem we bakute Gi, ba n’ulo uku Gi di nsọ.

8 Ndi nāriba ihe-efu di iche iche nke nābughi ihe ama,

Ebere-ha ka ha nārapu.

9 Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà;

Ihe nke m’kweworo na nkwa ka m’gākwughachi.

Nzọputa diri Jehova.

10 Jehova we gwa azù ahu okwu, o we b͕ọputa Jona n’ala-akọrọ.

Categories
JONA

JONA 3

1 Okwu Jehova we rue Jona nti nke ub͕ò abua, si,

2 Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku ahu, kpọsara ya nkpọsa ahu nke Mu onwem nāgwa gi.

3 Jona we bilie, jerue Nineve, dika okwu Jehova si di. Ma Nineve bu obodo di uku ri nne, ije nke ubọchi atọ.

4 Jona we malite ibà n’obodo ije nke otù ubọchi, o we kpọsa, si, Ọ fọduru ọgu ubọchi abua, ewe kwatue Nineve.

5 Ndi Nineve we kwere na Chineke; ha we kpọsa obubu-ọnu, yiri ákwà-nkpe, site n’onye uku ha we rue onye ntà ha.

6 Okwu ahu we rute eze Nineve aru, ọ we si n’oche-eze-ya bilie, yipu uwe-nwuda-ya n’aru ya, kpuchie onwe-ya n’ákwà-nkpe, nọkwasi na ntu.

7 O we tie nkpu, kwusa nime Nineve site n’iwu eze na ndi uku ya, si, Ka madu na anumanu, ma ìgwè ehi ma ìgwè ewu na aturu, ghara idetu ihe ọ bula n’ọnu: ka ha ghara izù onwe-ha, ghara kwa iṅu miri:

8 ma ka ha kpuchie onwe-ha n’ákwà-nkpe, ma madu ma anumanu, ka ha kpọkusi kwa Chineke ike: ka ha chighari kwa, onye ọ bula ya pua n’uzọ ọjọ ya, na n’ihe-ike nke di n’ọbu-aka-ha.

9 Ònye mara? eleghi anya Chineke gēchighari, chègharia uche, si n’iwe-Ya di ọku chigharia, ka ayi we ghara ila n’iyì.

10 Chineke we hu ọlu nile ha, na ha siri n’uzọ ọjọ ha chigharia; Chineke we chègharia uche bayere ihe ọjọ ahu, nke O kwuru, si na Ọ gēme ha; O meghi kwa ya.

Categories
JONA

JONA 4

1 O we jọ Jona ajọ njọ nke-uku, iwe-ya ewe di ọku.

2 O we kpere Jehova, si, Biko, Jehova, Ǹka abughi okwum, mb͕e m’nānọ n’alam? N’ihi nka ka m’buru uzọ b͕alaga na Tashish: n’ihi na amaram na Gi onwe-gi bu Chineke nke bu onye-amara, onye-obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ Nke nāba kwa uba n’ebere, Nke nēchèghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu I gēweta.

3 Ma ub͕u a, Jehova, biko, wepu ndum n’arum; n’ihi na ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.

4 Jehova we si, Ì nēme nke-ọma n’iwe iwe di ọku?

5 Jona we pua n’obodo, nọdu ala n’akuku Iru-anyanwu nke obodo, mere onwe-ya otù ulo-ntu n’ebe ahu, nọdu ala n’okpuru ya na ǹdò-ya, rue mb͕e ọ gāhu ihe gēme n’obodo.

6 Jehova, bú Chineke, we guputa otù ogili-ub͕a, me ka o tolite n’elu Jona, ka o we buru ǹdò n’elu isi-ya, inaputa ya n’ọnọdu ọjọ ya. Jona we ṅuria ọṅu nke-uku n’ihi ogili-ub͕a ahu.

7 Chineke we guputa otù ikpuru mb͕e chi bọrọ n’echi-ya, o we ribie ogili-ub͕a ahu, o we kpọnwua.

8 O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n’isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.

9 Chineke we si Jona, Ì nēme nke-ọma n’iwe iwe di ọku bayere ogili-ub͕a ahu? Ọ si, Anameme nke-ọma n’iwe iwe di ọku rue ọnwu.

10 Jehova we si, Gi onwe-gi mere ogili-ub͕a nka ebere, bú ihe nke i nādọb͕ughi onwe-gi n’ọlu n’ihi ya, nke i nēmeghi kwa ka ọ di uku; nke tolitere n’otù abali, la kwa n’iyì n’otù abali:

11 Mu onwem kwa, M’gaghi-emere Nineve ebere, bú obodo uku ahu; nke ihe kari orú nnù madu uzọ iri-na-ise nọ nime ya, bú ndi nāmaghi nke bu aka-nri-ha na aka-ekpe-ha; na ọtutu anumanu?