Categories
JỌN

JỌN 11

1 Ma aru otù nwoke adighi ike, bú Lazarọs onye Betani, onye sitere n’obodo ntà Meri na Mata nwa-nne-ya nwanyi.

2 Ma ọ bu Meri ahu nke were manu-otite te Onye-nwe-ayi, were kwa agiri-isi-ya hicha ukwu-Ya abua, onye aru nwa-nne-ya nwoke, bú Lazarọs, nādighi ike.

3 Ya mere umu-nne-ya nwanyi zigara Ya, si, Onye-nwe-ayi, le, aru nke onye ahu I huru n’anya adighi ike.

4 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si, Nriaria nka abughi nke ọnwu, kama ọ bu n’ihi otuto Chineke, ka ewe nye Ọkpara Chineke otuto site na ya.

5 Ma Jisus huru Mata, na nwa-nne-ya nwanyi, na Lazarọs, n’anya.

6 Ya mere mb͕e Ọ nuru na aru-ya adighi ike, mb͕e ahu Ọ nọgidere ubọchi abua n’ebe Ọ nọ.

7 Mb͕e ahu mb͕e nka gasiri Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Ka ayi je Judia ọzọ.

8 Ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Rabai, ub͕u a ka ndi-Ju nāchọ uzọ itu Gi nkume; Ì nēje kwa ebe ahu ọzọ?

9 Jisus zara, si, Ọ̀ bughi oge hour iri na abua di n’ehihie? Ọ buru na onye ọ bula ejeghari n’ehihie, ọ dighi-asu ngọngọ, n’ihi na ọ nāhu ìhè nke uwa nka.

10 Ma ọ buru na onye ọ bula ejeghari n’abali, ọ nāsu ngọngọ, n’ihi na ìhè adighi nime ya.

11 Ihe ndia ka O kwuru: mb͕e nka gasiri Ọ si ha, Enyi-ayi Lazarọs adawo n’ura; ma anamaga, ka M’we kpọte ya n’ura.

12 Ya mere ndi nēso uzọ-Ya siri Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ dawo n’ura, agāzọputa ya.

13 Ma Jisus kwururi okwu bayere ọnwu-ya: ma ndi ahu chère na Ọ nēkwu okwu bayere ida n’ura efu.

14 Ya mere Jisus gwawara ha okwu mb͕e ahu, si, Lazarọs nwuru anwu.

15 Anamaṅuri kwa ọṅu n’ihi unu na adighi m n’ebe ahu, ka unu we kwere; otú ọ di, ka ayi jekuru ya.

16 Ya mere Tomas, onye anākpọ Didimọs, siri ibe-ya ndi nēso Jisus, Ka ayi onwe-ayi je kwa, ka ayi we so Ya nwua.

17 Ya mere mb͕e Jisus biara, Ọ huru na ọ diwori n’ílì ubọchi anọ a.

18 Ma Betani di Jerusalem nso, ihe dika furlong iri na ise n’idi-anya;

19 ma ọtutu n’etiti ndi-Ju biakutereri Mata na Meri, ka ha we kasie ha obi n’ihi nwa-nne-ha.

20 Ya mere mb͕e Mata nuru na Jisus nābia, o je zute Ya: ma Meri nānọdu n’ulo.

21 Ya mere Mata siri Jisus, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n’ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori.

22 Ma ọbuná ub͕u a amataram na, ka ihe I gāriọ n’aka Chineke ra, Chineke gēnye Gi.

23 Jisus si ya, Nwa-nne-gi nwoke gēsi n’ọnwu bilie.

24 Mata si Ya, Amataram na o gēsi n’ọnwu bilie na nbilite-n’ọnwu n’ubọchi ikpe-azu.

25 Jisus siri ya, Mu onwem bu nbilite-n’ọnwu na ndu: onye nēkwere na Mu, ọbuná ma asi na ọ nwuru anwu, ọ gādi ndu ọzọ:

26 ọzọ, onye ọ bula nke nādi ndu, nke nēkwere kwa na Mu, ọ gaghi-anwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. I kwere nka?

27 Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi: Mu onwem ekwerewo na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, Ọkpara Chineke, Onye nābia n’uwa.

28 Mb͕e o kwusiri nka, o we je kpọ Meri nwa-nne-ya nwanyi na nzuzo, si, Onye-ozizí nọ n’ebe a, Ọ nāekpọ kwa gi.

29 Ma nwanyi ahu, mbe ọ nuru ya, o bilie ọsọsọ, we biakute Ya.

30 (Ma Jisus akābiarughi nime obodo ntà ahu, kama Ọ nānọ n’ebe Mata zutere Ya.)

31 Ya mere ndi-Ju ndi ha na ya di n’ulo, ndi nākasi kwa ya obi, mb͕e ha huru Meri, na o biliri ọsọsọ we pua, ha soro ya, nēchè na ọ nējeru ílì ka o we kwa ákwá n’ebe ahu.

32 Ya mere Meri, mb͕e ọ biara n’ebe Jisus nọ, mb͕e ọ huru Ya, ọ da n’ala n’ukwu-Ya, nāsi Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n’ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori.

33 Ya mere mb͕e Jisus huru ya ka ọ nākwa ákwá, na ndi-Ju ndi soro ya bia ka ha nākwa kwa ákwá, Ọ su udè nime mọ-Ya, me kwa ka obi lọ Ya miri,

34 O we si, Òle ebe unu tọb͕ọworo ya? Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, Bia, le kwa.

35 Anya-miri puru n’anya Jisus.

36 Ya mere ndi-Ju nāsi, Le otú Ọ huru ya n’anya!

37 Ma ufọdu nime ha siri, Onye a, Nke meghere anya onye ahu kpuru ìsì, Ọ̀ pughi ime kwa ka nwoke a ghara inwu anwu?

38 Ya mere Jisus nābiaru ílì ahu nāsu udè ọzọ nime Onwe-ya. Ma ọ bu ọb͕à, otù nkume nātọb͕ọ kwa n’ọnu-ya.

39 Jisus si, Wepunu nkume ahu. Mata, nwa-nne-nwanyi nke onye ahu nwuruwori, si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ nēsì ísì ub͕u a: n’ihi na nka mere ya ubọchi anọ ọ nwuru.

40 Jisus si ya, Àsighi m i na, ọ buru na i kwere, i gāhu ebube Chineke?

41 Ya mere ha wepuru nkume ahu. Ma Jisus weliri anya-Ya elu, si, Nna, ekelem I na I nuru olum.

42 Ma Mu onwem matara na I nānu olum mb͕e nile: ma n’ihi ìgwè madu a nke guzoro gburugburu ka M’kwuru ya, ka ha we kwere na ọ bu Gi onwe-gi ziterem.

43 Ma mb͕e O kwusiri ihe ndia, O were oké olu tie nkpu, si, Lazarọs, puta n’èzí.

44 Onye nwururi anwu putara, ewerewori ákwà-ozu ke ya ukwu na aka; were kwa ichafọ kechie ya iru. Jisus si ha, Tọpunu ya, ghara kwa ya ka ọ la.

45 Ya mere ọtutu n’etiti ndi-Ju, ndi biakutere Meri, ndi le-kwa-ra ihe O mere, ha kwere na Ya.

46 Ma ufọdu n’etiti ha jekuru ndi-Farisi, kọrọ ha ihe Jisus mere.

47 Ya mere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi kpọrọ nnọkọ-ikpé ka ha zukọ, si, Gini ka ayi nēme? n’ihi na Nwoke a nēme ọtutu ihe-iriba-ama.

48 Ọ buru na ayi arapu Ya otú a, madu nile gēkwere na Ya: ndi Rom gābia kwa napu ebe nke ayi na mba nke ayi.

49 Ma otù onye n’etiti ha, bú Kaiafas, ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n’arọ ahu, si ha, Unu onwe-unu amataghi ihe ọ bula,

50 unu atuleghi kwa uche na ọ bara unu urù ka otù onye nwua n’ọnọdu ndi-Ju, ka mba-ayi dum ghara ila kwa n’iyì.

51 Ma o kwughi nka site n’onwe-ya: kama ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n’arọ ahu, o buru amuma na Jisus gaje inwu anwu n’ọnọdu mba ahu;

52 ọ bughi kwa nání n’ọnọdu mba ahu, kama ka O we me kwa ka umu Chineke ndi b͕asaworo zukọ n’otù.

53 Ya mere site n’ubọchi ahu ha b͕ara ìzù ka ha we b͕ue Ya.

54 Ya mere Jisus adighi-ejeghari n’iru ọra madu n’etiti ndi-Ju ọzọ, kama O si n’ebe ahu je ba n’ala nke di ọhia nso, ba n’obodo anākpọ Ifraim; O we nọgide n’ebe ahu, Ya na ndi nēso uzọ-Ya.

55 Ma ememe ngabiga nke ndi-Ju di nso: ọtutu madu we si n’ala ndi-Ju rigoro Jerusalem mb͕e ememe ngabiga ahu akērughi, ime onwe-ha ka ha di ọcha.

56 Ya mere ha nāchọ Jisus, we nēkwurita n’etiti onwe-ha, mb͕e ha guzoro n’ulo uku Chineke, si, Gini ka unu nēchè? Nà Ọ gaghi-abia n’ememe a ma-ọli?

57 Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi nyereri iwu ka, ọ buru na onye ọ bula mara ebe Ọ nọ, ka o gosi ya, ha we jide Ya.

Categories
JỌN

JỌN 12

1 Ya mere mb͕e ubọchi isi fọduru ka ememe ngabiga rue, Jisus biaruru Betani, ebe Lazarọs nọ, onye Jisus mere ka o si na ndi nwuru anwu bilie.

2 Ya mere ha siri Ya nri-anyasi n’ebe ahu: Mata nēje kwa ozi; ma Lazarọs bu otù onye n’etiti ndi Ya na ha nọduru na nri.

3 Ya mere Meri were manu-otite ezi nard, di oké ọnu-ahia nke-uku, nke ọtùtù-ya ruru otù pound, te ukwu Jisus abua, were kwa agiri-isi-ya hicha ukwu-Ya: ísì manu-otite ahu we juputa ulo ahu.

4 Ma Judas Iskariot, otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya, nke gaje irara Ya nye, si,

5 N’ìhi gini ka anēreghi manu-otite a ọgu shilling iri na ise, were ya nye ndi-ob͕eye?

6 Ma nka ka o kwuru, ọ bughi n’ihi na ọ kpọrọ ndi-ob͕eye ihe; kama n’ihi na ọ bu onye-ori, na ebe o ji àkpà-ego, ọ nēwepu ihe anētiye nime ya.

7 Ya mere Jisus siri, Rapu nwanyi a ka o we debe ya rue ubọchi olìlìm.

8 N’ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n’etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.

9 Ya mere ọra madu n’etiti ndi-Ju mara na Ọ nọ n’ebe ahu: ha we bia, ọ bughi n’ihi nání Jisus, kama ka ha we le kwa Lazarọs, onye Ọ mereri ka o si na ndi nwuru anwu bilie.

10 Ma ndi-isi-nchu-àjà b͕ara ìzù ka ha we b͕u kwa Lazarọs;

11 n’ihi na ọ bu n’ihi ya ka ọtutu nime ndi-Ju nāpu, nēkwere kwa na Jisus.

12 N’echi-ya oké ìgwè madu nke biara ememe ahu, mb͕e ha nuru na Jisus nābia Jerusalem,

13 ha chiri igu nkwu, pua izute Ya, we nēti nkpu, si, Hosanna: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n’aha Onye-nwe-ayi, bú Eze nke Israel.

14 Ma mb͕e Jisus chọtasiri otù nwa-inyinya-ibu, Ọ nọkwasi ya; dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

15 Atula egwu, ada Zaion: le, Eze-gi nābia, nānọkwasi nwa inyinya-ibu.

16 Ihe ndia ndi nēso uzọ-Ya amaghi na mbu: kama mb͕e enyereri Jisus otuto, mb͕e ahu ka ha chetara na edereri ihe ndia bayere Ya n’akwukwọ nsọ, na ha me-kwa-ra Ya-ri ihe ndia.

17 Ya mere ìgwè madu ahu ndi ha na Ya nọ mb͕e O siri n’ílì kpọputa Lazarọs, me kwa ka o si na ndi nwuru anwu bilie, ha nāb͕a àmà.

18 Ọ bu kwa n’ihi nka ka ìgwè madu ahu puru izute Ya, n’ihi na ha nuru na O mereri ihe-iriba-ama nka.

19 Ya mere ndi-Farisi siritara onwe-ha, Lenu na okwu-unu abaghi n’ihe: le, uwa ejesowo Ya n’azu.

20 Ma ndi-Grik ufọdu di n’etiti ndi nārigo ka ha kpọ isi ala nye Chineke n’ememe ahu:

21 ya mere madu ndia biakutere Filip, nke bu onye Betsaida nke Galili, ha we kpere ya, si, Onye-nwe-ayi, ayi nāchọ ihu Jisus.

22 Filip bia gwa Andru: Andru we bia, ya na Filip, ha we gwa Jisus.

23 Jisus we za ha, si, Oge hour abiawo, ka ewe nye Nwa nke madu otuto.

24 N’ezie, n’ezie, asim unu, Ọ buru na nkpuru ọka adaghi n’ala we nwua, nání ya onwe-ya nānọgide; ma ọ buru na ọ nwuru, ọ mia ọtutu nkpuru.

25 Onye nāhu ndu-ya n’anya nētufu ya; onye nākpọ kwa ndu-ya asì n’uwa nka gēdebe ya rue ndu ebighi-ebi.

26 Ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya som; ebe Mu onwem nọ kwa, n’ebe ahu ka onye nējerem ozi gānọ kwa: ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya ka Nnam gāsọpuru.

27 Ub͕u a ka nkpuru-obim nālọ miri; gini ka M’gēkwu kwa? Nna, zọputam n’oge hour nka. Ma n’ihi nka ka M’biaruru oge hour nka.

28 Nna, nye aha-Gi otuto. Ya mere otù olu sitere n’elu-igwe da, si, Enyerem ya otuto, M’gēnye kwa Ya otuto ọzọ.

29 Ya mere ìgwè madu ahu, ndi guzoro nso, ndi nu-kwa-ra ya, siri na éb͕è-elu-igwe dara: ndi ọzọ siri, Mọ-ozi agwawo Ya okwu.

30 Jisus zara, si, Ọ bughi n’ihim ka olu a daworo, kama ọ bu n’ihi unu.

31 Ub͕u a ka ikpé uwa nka di: ub͕u a ka agāchupu onye-isi uwa nka.

32 Mu onwem, ọ buru na eweliem elu site n’ala, M’gādọrọ kwa madu nile nye onwem.

33 Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gaje inwu.

34 Ya mere ìgwè madu ahu zara Ya, si, Ayi onwe-ayi nuru site n’iwu-ayi na Kraist-ayi nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi: Gì onwe-gi si kwa aṅa si, Aghaghi iweli Nwa nke madu elu? Ònye bu Nwa nke madu a?

35 Ya mere Jisus siri ha, Nwa oge fọduru ka Ìhè ahu gādi n’etiti unu. Nējegharinu mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, ka ọchichiri ghara ijide unu: onye nējeghari n’ọchichiri adighi-amata ebe ọ nēje.

36 Mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, kwerenu n’Ìhè ahu, ka unu we ghọ umu Ìhè.

Ihe ndia ka Jisus kwuru, O we je zonari ha Onwe-ya.

37 Ma ọ bu ezie na O mereri ọtutu ihe-iriba-ama di otú a n’iru ha, ma ha ekweghi na Ya:

38 ka okwu Aisaia onye-amuma we mezu, nke o kwuru, si,

Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo?

Ogwe-aka Onye-nwe-ayi kwa, n’àru onye ka ekpugheworo ya?

39 N’ihi nka ha apughi ikwere, n’ihi na Aisaia siri ọzọ,

40 O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili;

Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta,

Ghara kwa ichighari,

Ka M’ghara kwa ime ka aru di ha ike.

41 Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n’ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu-kwa-ra okwu bayere Ya.

42 Otú ọ di, ọbuná site n’etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n’ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n’ulo-nzukọ:

43 n’ihi na ha huru otuto madu n’anya kari otuto Chineke.

44 Jisus we tie nkpu, si, Onye kwere na Mu, ọ bughi na Mu ka o kwere, kama ọ bu n’Onye ziterem.

45 Onye nāhum nāhu kwa Onye ziterem.

46 Mu onwem abiawo n’uwa ibu ìhè, ka onye ọ bula nke kwere na Mu we ghara inọgide n’ọchichiri.

47 Ọ buru kwa na onye ọ bula anu okwum, ghara idebe ha, Mu onwem agaghi-ekpe ya ikpé: n’ihi na abiaghm ka M’kpe uwa ikpé, kama ka M’zọputa uwa.

48 Onye nājum, nke nādighi-anara kwa okwum, o nwere onye nēkpe ya ikpé: okwu nke M’kwuru, okwu ahu gēkpe ya ikpé n’ubọchi ikpe-azu.

49 N’ihi na Mu onwem ekwughi site n’Onwem; kama Nna ziterem, Ya onwe-ya enyewom iwu, ihe M’gēkwu, na otú M’gēkwu ya.

50 Amata-kwa-ram na ihe O nyere n’iwu bu ndu ebighi-ebi: ya mere ihe Mu onwem nēkwu, dika Nnam gwaworom okwu, otú a ka M’nēkwu.

Categories
JỌN

JỌN 13

1 Ma mb͕e ememe ngabiga akērughi, ebe Jisus matara na oge hour Ya abiawo ka O si n’uwa nka lakuru Nna-Ya, ebe Ọ huru ndi nke aka Ya nọ n’uwa n’anya, Ọ huru ha n’anya rue ogwugwu ihe nile.

2 Mb͕e ha nēri nri-anyasi, mb͕e ekwensu tinyesiri ub͕u a n’obi Judas Iskariot, nwa Saimon, ka ọ rara Ya nye,

3 Jisus, ebe Ọ matara na nna-Ya nyere Ya-ri ihe nile n’aka, na O si-kwa-ra n’ebe Chineke nọ puta, nālakuru kwa Chineke,

4 O bilie na nri-anyasi, wusa uwe-Ya, we chiri ákwà anēji hicha aru, we ke Onwe-ya n’úkwù.

5 Mb͕e ahu O tinye miri n’ihe anēji sa aru, we malite isa ukwu ndi nēso uzọ-Ya, na iji ákwà anēji hicha aru nke O kereri n’úkwù hicha ukwu-ha.

6 Ya mere Ọ biakute Saimon Pita. Ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, Gì onwe-gi nāsa ukwum?

7 Jisus zara, si Ya, Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.

8 Pita si Ya, I gaghi-asa ukwum ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. Jisus zara ya, si, Ọ buru na asaghm i, Mu na gi enweghi òkè ọ bula.

9 Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ bughi nání ukwum, kama akam abua kwa na isim.

10 Jisus si ya, Onye asaworo aru, nkpà isa aru ọzọ adirighi ya ma-ọbughi isa ukwu-ya, kama aru-ya dum di ọcha: unu onwe-unu di kwa ọcha, ma ọ bughi unu nile.

11 N’ihi na Ọ matara onye gaje irara Ya nye; n’ihi nka ka Ọ siri, Ọ bughi unu nile di ọcha.

12 Ya mere mb͕e Ọ sasiri ukwu-ha, chiri kwa-uwe Ya, nọdu kwa ala ọzọ, Ọ si ha, Ùnu mara ihe M’meworo unu?

13 Unu onwe-unu nākpọm, Onye-ozizí, na, Onye-nwe-ayi: unu nēkwu kwa nke-ọma; n’ihi na ọ bu otú M’di.

14 Ya mere, Ọ buru na Mu onwem, bú Onye-nwe-unu na Onye-ozizí-unu, sara ukwu-unu, unu onwe-unu nēji kwa ugwọ isarita ukwu ibe-unu.

15 N’ihi na enyewom unu ihe-nṅomi, ka unu onwe-unu we nēme kwa dika Mu onwem mere unu.

16 N’ezie, n’ezie, asim unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku; onye-ozi adighi-aka kwa onye zitere ya uku.

17 Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha.

18 Ekwughm okwu bayere unu nile: Mu onwem matara ndi M’rọputara: kama ọ bu ka emezu ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, Onye nēri nrim buliri ikiri-ukwu-ya imegidem.

19 Site n’ub͕u a anamagwa unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere na Mu onwem bu Ya mb͕e ọ bula ọ gēru.

20 N’ezie, n’ezie, asim unu, Onye nānara onye ọ bula M’gēzite, Mu ka ọ nānara; onye nānaram nānara kwa Onye ziterem.

21 Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, obi lọrọ Ya miri nime mọ-Ya, O we b͕a àmà, si, N’ezie, n’ezie, asim unu, na otù onye n’etiti unu gāraram nye.

22 Ndi nēso uzọ-Ya nēlerita onwe-ha anya, nēnwe obi abua onye Ọ nēkwu okwu bayere ya.

23 Otù onye n’etiti ndi nēso uzọ-Ya nānọdu na nri nādabere n’obi Jisus, onye Jisus huru n’anya.

24 Ya mere Saimon Pita fere onye ahu isi, we si ya, Gwa ayi onye O nēkwu okwu bayere ya.

25 Onye ahu dabere, otú ọ di, n’obi Jisus, we si Ya, Onye-nwe-ayi, ònye ka ọ bu?

26 Ya mere Jisus za, si, Ọ bu onye ahu, nke Mu onwem gēsuru iberibe achicha n’ofé, nye ya. Ya mere, mb͕e O susiri iberibe achicha ahu, O were ya nye Judas, nwa Saimon Iskariot.

27 Mb͕e enyesiri ya iberibe achicha ahu, mb͕e ahu Setan batara nime onye ahu. Ya mere Jisus si ya, Ihe i nēme, me ya ọsọsọ.

28 Ma ọ dighi onye ọ bula nime ndi nọduru na nri mara ihe O ji gwa ya okwu a.

29 N’ihi na ufọdu nēchè, ebe Judas ji àkpà-ego, na Jisus siri ya, Zuta ihe di ayi nkpà n’ememe; ma-ọbu, ka o nye ndi-ob͕eye ihe.

30 Ya mere mb͕e ọ narasiri iberibe achicha ahu ọ pua ngwa ngwa: ma ọ bu abali.

31 Ya mere mb͕e ọ pururi, Jisus si, Ub͕u a ka enyere Nwa nke madu otuto, enye-kwa-ra Chineke otuto nime Ya;

32 Chineke gēnye kwa Ya otuto nime Onwe-ya, ngwa ngwa ka Ọ gēnye kwa Ya otuto.

33 Umu-ntakiri, ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ. Unu gāchọm: dika M’gwa-kwa-ra ndi-Ju, si, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia; otú ahu ka M’nāsi unu ub͕u a.

34 Iwu ọhu M’nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n’anya; dika M’huru unu n’anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n’anya.

35 Madu nile gēji nka mara na unu bu ndi nēso uzọm, ọ buru na unu enwerita ihu-n’anya n’ebe ibe-unu nọ.

36 Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, Òle ebe I nāla? Jisus zara, si, Ebe M’nāla, i pughi isom ub͕u a; ma i gēsom ma emesia.

37 Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, n’ìhi gini ka m’nāpughi iso Gi ọbuná ub͕u a? m’gātọb͕ọ ndum n’ihi Gi.

38 Jisus zara, si, Ì gātọb͕ọ ndu-gi n’ihim? N’ezie, n’ezie, asim i, Oke-ọkuku agaghi-akwa, rue mb͕e i gāgọnarim ub͕ò atọ.

Categories
JỌN

JỌN 14

1 Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu.

2 N’ulo Nnam ọtutu ebe-obibi di; ọ buru na ọ bughi otú a, M’gāgwawori unu; n’ihi na anamaga idoziri unu ebe.

3 Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M’gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ.

4 Ebe Mu onwem nāla, unu mata-kwa-ra uzọ-ya.

5 Tomas si Ya, Onye-nwe-ayi, ayi amataghi ebe I nāla; àyi si aṅa mata uzọ-ya?

6 Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu.

7 Ọ buru na unu maramri, unu gāmatawo-kwa-ri Nnam: site n’ub͕u a unu mara Ya, unu ahuwo kwa Ya.

8 Filip si Ya, Onye-nwe-ayi, gosi ayi Nna ahu, ọ gēzu-kwa-ra ayi.

9 Jisus si ya, Ogologo oge di otú a ka Mu na gi nọ, ma ì mataghm, Filip? onye huworom anya ahuwo Nnam anya; gì onwe-gi si aṅa si, Gosi ayi Nnam ahu?

10 Ì kweghi na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem? okwu Mu onwem nāgwa unu ekwughi m n’Onwem: ma Nnam Nke nēbi nimem nālu ọlu-Ya.

11 Kwerenum na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem: ma ọ bughi, kwerenum n’ihi ọlum onwe-ha.

12 N’ezie, n’ezie, asim unu, Onye nēkwere na Mu, ọlu Mu onwem nālu ka onye ahu gālu kwa; ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa; n’ihi na Mu onwem nāgakuru Nnam.

13 Ihe ọ bula unu gāriọ kwa n’aham, ihe ahu ka M’gēme, ka ewe nye Nnam otuto nime Ọkpara-Ya.

14 Ọ buru na unu gāriọm ihe ọ bula n’aham, nke ahu ka M’gēme.

15 Ọ buru na unu nāhum n’anya, unu gēdebe ihe nile M’nyere n’iwu.

16 Mu onwem gēkpe-kwa-ra Nnam, Ọ gēnye kwa unu Onye-nkasi-obi ọzọ, ka Ọ nọyere unu rue mb͕e ebighi-ebi,

17 bú Mọ nke ezi-okwu: Onye uwa nāpughi inara; n’ihi na ọ dighi-ahu ya, ọ dighi-ama kwa Ya: unu onwe-unu mara Ya; n’ihi na Ya na unu nānọgide, Ọ gānọ kwa nime unu.

18 M’gaghi-arapu unu ka umu-nb͕ei: agajem ibiakute unu.

19 Ọ fọduru nwa oge, uwa ahukwaghm ọzọ; ma unu onwe-unu nāhum: unu onwe-unu gādi kwa ndu, n’ihi na Mu onwem nādi ndu.

20 N’ubọchi ahu unu onwe-unu gāmara na Mu onwem nọ nime Nnam, na unu onwe-unu nọ kwa nimem, na Mu onwem nọ kwa nime unu.

21 Onye nwere ihe M’nyere n’iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n’anya: onye nāhum n’anya, Nnam gāhu kwa ya n’anya, Mu onwem gāhu kwa ya n’anya, were kwa Onwem gosi ya.

22 Judas (ọ bughi Iskariot) si Ya, Onye-nwe-ayi, Gini putaworo na I gaje iwere Onwe-gi gosi ayi, ma ọ bughi uwa?

23 Jisus zara, si ya, Ọ buru na madu ahum n’anya, ọ gēdebe okwum: Nnam gāhu kwa ya n’anya, Ayi gābiakute kwa ya, nēme kwa ebe-obibi-Ayi n’ebe ọ nọ.

24 Onye nādighi-ahum n’anya adighi-edebe okwum nile: okwu nke unu nānu abughi kwa nkem, kama ọ bu nke Nna Onye ziterem.

25 Okwu ndia ka M’gwaworo unu, mb͕e Mu na unu nānọgide.

26 Ma Onye-nkasi-obi ahu, bú Mọ Nsọ, Onye Nnam gēzite n’aham, Onye ahu gēzí unu ihe nile, me kwa ka unu cheta okwu nile Mu onwem gwara unu.

27 Udo ka M’rapuru unu; udo nkem ka M’nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ.

28 Unu nuru na Mu onwem siri unu, Anamala, biakute kwa unu. Ọ buru na unu hurum n’anya, unu gāṅuwori ọṅu, n’ihi na anamagakuru Nnam: n’ihi na Nnam ka Mu onwem uku.

29 Ub͕u a agwawokwam unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere mb͕e ọ bula ọ gēru.

30 Ọ dighi ọtutu okwu Mu na unu gēkwu ọzọ site n’ub͕u a, n’ihi na onye-isi nke uwa nka nābia: ọ dighi kwa ihe ọ bula o nwere nimem;

31 ma ka uwa we mara na anamahu Nnam n’anya, ka ọ mara kwa na dika Nnam nyerem iwu, otú ahu ka M’nēme. Bilienu, ka ayi si n’ebe a pua.

Categories
JỌN

JỌN 15

1 Mu onwem bu ezi osisi vine, Nnam bu kwa onye-ọlu-ubi.

2 Alaka ọ bula nimem nke nādighi-ami nkpuru, O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, O nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o we mia nkpuru kari.

3 Ub͕u a unu onwe-unu di ọcha n’ihi okwu nke M’gwaworo unu.

4 Nọgidenu nimem, Mu onwem kwa nime unu. Dika alaka nāpughi imi nkpuru n’onwe-ya, ọ buru na ọ nọgideghi n’osisi vine; otú a ka unu onwe-unu nāpughi, ọ buru na unu anọgideghi nimem.

5 Mu onwem bu osisi vine ahu, unu onwe-unu bu alaka nkem: Onye nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya, onye ahu nāmi nkpuru ri nne: n’ihi na unu apughi ime ihe ọ bula ma Mu anọghi ya.

6 Ọ buru na onye ọ bula anọgideghi nimem, atupu ya n’èzí dika alaka, ọ kpọnwu kwa; ha we chikọta ha, tubà ha n’ọku, ewe rechapu ha ọku.

7 Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe o bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya.

8 Nime nka ka anēnye Nnam otuto, ka unu nāmi nkpuru ri nne; unu gābu kwa ndi nēso uzọm.

9 Dika Nnam hurum n’anya, Mu onwem hu-kwa-ra unu n’anya: nọgidenu nime ihu-n’anyam.

10 Ọ buru na unu edebe ihe nile M’nyere n’iwu, unu gānọgide n’ihu-n’anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n’iwu, nọgide kwa n’ihu-n’anya-Ya.

11 Ihe ndia ka M’gwaworo unu, ka ọṅùm we di nime unu, ka ọṅù-unu we zu kwa.

12 Nka bu ihe M’nyere n’iwu ka unu hurita ibe-unu n’anya, dika M’huru unu n’anya.

13 Ọ dighi onye ọ bula nwere ihu-n’anya kari nka uku, ka madu tọb͕ọ ndu-ya n’ihi ndi-enyì-ya.

14 Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n’iwu.

15 Akpọkwaghm unu ndi-orù ọzọ site n’ub͕u a; n’ihi na orù adighi-amara ihe onye-nwe-ya nēme: ma akpọwom unu ndi-eyì; n’ihi na ihe nile M’nuru site n’ọnu Nnam ka M’mere ka unu mara.

16 Ọ bughi unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa: ka ihe ọ bula unu gāriọ Nnam n’aham, ka O we nye unu ya.

17 Ihe ndia ka M’nēnye unu n’iwu, ka unu we hurita ibe-unu n’anya.

18 Ọ buru na uwa akpọ unu asì, unu mara na ọ kpọwo Mu onwem asì mb͕e ọ kākpọghi unu asì.

19 Ọ buru na unu sitere n’uwa, uwa gāhu ihe nke aka ya n’anya: ma n’ihi na unu esiteghi n’uwa, kama Mu onwem rọputara unu nime uwa, n’ihi nka uwa nākpọ unu asì.

20 Chetanu okwu Mu onwem gwara unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sob͕urum, ha gēsọb͕u kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu.

21 Ma ihe ndia nile ka ha gēme unu n’ihi aham, n’ihi na ha amataghi Onye ziterem.

22 Ọ buru na abiaghm, ọ buru kwa na agwaghm ha okwu, ha agaghi-enwewori nmehie: ma ub͕u a ha enweghi ihe-agugọ bayere nmehie-ha.

23 Onye nākpọm asì nākpọ kwa Nnam asì.

24 Ọ buru na alughm ọlu n’etiti ha nke onye ọzọ nālughi, ha agaghi-enwewori nmhie: ma ub͕u a ha ahuwo kpọ kwa Mu na Nnam asì.

25 Ma nka mere, ka okwu edeworo n’iwu-ha we mezu, Ha kpọrọm asì n’efu.

26 Ma mb͕e ọ bula Onye-nkasi-obi ahu gābia, Onye Mu onwem gēsi n’ebe Nnam nọ zitere unu, bú Mọ nke ezi-okwu, Onye si na Nnam puta, Onye ahu gāb͕aram àmà:

27 unu onwe-unu nāb͕a kwa àmà, n’ihi na Mu na unu nọ site na mbu.

Categories
JỌN

JỌN 16

1 Okwu ndia ka M’gwaworo unu, ka ewe ghara ime ka unu ma n’ọnyà.

2 Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.

3 Ihe ndia ka ha gēme kwa, n’ihi na ha amaghi Nnam, ha amaghi kwa Mu.

4 Ma okwu ndia ka M’gwaworo unu, ka, mb͕e ọ bula oge hour ha gābia, ka unu we cheta ha, na Mu onwem gwara unu. Ma agwaghm unu okwu ndia site na mbu, n’ihi na Mu na unu nọri.

5 Ma ub͕u a anamalakuru Onye ziterem; ọ dighi kwa onye ọ bula nime unu nājum, Òle ebe I nāla?

6 Kama n’ihi na M’gwawo unu okwu ndia, ihe-nwuta ejuputawo obi-unu.

7 Otú ọ di, Mu onwem nāgwa unu ezi-okwu; Ọ bu ihe bara unu urù ka Mu onwem la: n’ihi na asi na alaghm, Onye-nkasi-obi ahu agaghi-abiakute unu; ma ọ buru na alam, M’gēzite Ya nye unu.

8 Onye ahu, mgbe Ọ gābia, Ọ gātu kwa uwa nmehie, na ezi omume, na ikpé, n’anya:

9 nmehie, n’ihi na ha ekweghi na Mu;

10 ezi omume, n’ihi na anamalakuru Nnam, unu adighi-ahu-kwam ọzọ site n’ub͕u a;

11 ikpé, n’ihi na ekpewo onye-isi uwa nka ikpé.

12 Enwerem ọtutu ihe ọzọ igwa unu, ma unu apughi ibūru ha ub͕u a.

13 Ma mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēdubà unu n’ezi-okwu nile: n’ihi na Ọ gaghi-ekwu n’Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia.

14 Onye ahu gēto Mu onwem: n’ihi na Ọ gēwere n’ihe nkem, kọ-kwa-ra unu ya.

15 Ka ha ra, bú ihe nile Nnam nēnwe, bu nkem: n’ihi nka ka M’siri, na Ọ nēwere n’ihe nkem, gākọ-kwa-ra unu ya.

16 Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam.

17 Ya mere ufọdu nime ndi nēso uzọ-Ya siritara ibe-ha, Gini bu okwu a nke Ọ nāgwa ayi, si, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam: na, N’ihi na anamalakuru Nnam?

18 Ya mere ha nāsi, Gini bu okwu a nke Ọ nēkwu, Ọ fọduru nwa oge? Ayi amataghi ihe Ọ nēkwu.

19 Jisus mara na ha nāchọ iju Ya, O we si ha, Ùnu nājurita onwe-unu ihe bayere nka, na M’siri, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam ọzọ; ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam?

20 N’ezie, n’ezie, asim unu, na unu onwe-unu gēti nkpu ákwá, kwa kwa ákwá, ma uwa gāṅuri ọṅu: ọ gēwuta unu onwe-unu, ma nwuta-unu gāghọ ọṅù.

21 Nwanyi, mb͕e ọ bula ime nēme ya, o nwere ihe-nwuta, n’ihi na oge hour ya abiawo: ma mb͕e ọ bula ọ muputara nwa, o chetaghi ahuhu-ya ọzọ, n’ihi ọṅù-ya na amuputara madu n’uwa.

22 Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M’gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu.

23 N’ubọchi ahu ọ dighi ihe ọ bula unu gājum. N’ezie, n’ezie, asim unu, Ọ buru na unu gāriọ Nnam ihe ọ bula, Ọ gēnye unu ya n’aham.

24 Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n’aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.

25 Agwawom unu ihe ndia n’ilu: oge hour nābia, mb͕e M’nāgaghi-agwa unu okwu n’ilu ọzọ, kama M’gāgwawa unu okwu bayere Nnam.

26 N’ubọchi ahu unu gāriọ n’aham: ma asighm unu, na Mu onwem gēkpere Nnam n’ihi unu;

27 n’ihi na Nnam onwe-ya nāhu unu n’anya, n’ihi na unu onwe-unu huworom n’anya, kwere kwa na Mu onwem siri n’ebe Nnam nọ puta.

28 Esirim na Nnam puta, abiawokwam n’uwa: ọzọ, anamarapu uwa, nāgakuru kwa Nnam.

29 Ndi nēso uzọ-Ya si, Le, ub͕u a I nēkwuwa okwu, I dighi-atu kwa ilu.

30 Ub͕u a ayi nāmata na I matara ihe nile, na ọ dighi kwa Gi nkpà ka onye ọ bula jua Gi: nka ka ayi ji kwere na I siri n’ebe Chineke nọ puta.

31 Jisus zara ha, si, Ọ̀ bu ub͕u a ka unu kwere?

32 Le, oge hour nābia, ọ biawo kwa, ka unu gāb͕asa, onye ọ bula ọ la na nke ya, unu gārapu kwa nání Mu: otú ọ di, nání Mu anọghi, n’ihi na Mu na Nnam nọ.

33 Okwu ndia ka M’gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N’uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa.

Categories
JỌN

JỌN 17

1 Okwu ndia ka Jisus kwuru: O we welie anya-Ya le elu-igwe, si, Nnam oge hour abiawo; nye Ọkpara-Gi otuto, ka Ọkpara-Gi we nye Gi Otuto:

2 dika I nyere Ya ike n’ebe madu nile nọ, ka ihe ọ bula I nyeworo Ya, ka O we nye ha ndu ebighi-ebi.

3 Ma nka bu ndu ebighi-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nání Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist.

4 Mu onwem nyere Gi otuto n’elu uwa, ebe M’luzuru ọlu I nyeworom ka M’lua.

5 Nna, Gi onwe-gi were kwa otuto nke M’nwere n’ebe I nọ mb͕e uwa akādighi nyem otuto ub͕u a nebe Gi onwe-Gi nọ.

6 Emerem ka aha-Gi puta ìhè nye ndi I nyerem site ‘uwa: Gi onwe-gi nwere ha, I were kwa ha nyem; ha edebewo kwa okwu-Gi.

7 Ha mara ub͕u a na ihe nile, ka ha ra, bú nke I nyeworom, si n’ebe I nọ puta:

8 n’ihi na okwu I nyerem ka M’nyeworo ha; ha onwe-ha we nara ha, mara kwa n’ezie na esim n’ebe I nọ puta, ha kwere kwa na Gi onwe-gi ziterem.

9 Mu onwem nēkpe ekpere bayere ha: ọ bughi uwa ka M’nēkpe ekpere bayere ya, kama anamekpe ekpere bayere ndi I nyeworom; n’ihi na ha bu nke Gi:

10 ihe nile nke bu nkem bu kwa nke Gi, nke Gi bu kwa nkem: enyewokwam otuto nime ha.

11 Anọkwaghm n’uwa ọzọ, ma ndia nọ n’uwa, Mu onwem nābiakute kwa Gi. Nna di nsọ, nēdebe ha n’aha-Gi nke I nyeworom, ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu.

12 Mb͕e Mu na ha nọri, Mu onwem nēdebe ha n’aha-Gi nke I nyeworom: eche-kwa-ram ha, ọ dighi kwa onye ọ bula nime ha lara n’iyì, ma-ọbughi nwa nke ila-n’iyì ahu; ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ we mezu.

13 Ma anamabiakute Gi ub͕u a; okwu ndia ka M’nēkwu kwa nuwa, ka ha we nwe ọṅùm ka o zuworo nime onwe-ha.

14 Mu onwem enyewo ha okwu-Gi; uwa kpọ-kwa-ra ha asì, n’ihi na ha esiteghi n’uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n’uwa.

15 Ekpeghm ekpere ka I wepu ha n’uwa, kama ka I debe ha ka ha pua n’aka ajọ onye ahu.

16 Ha esiteghi n’uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n’uwa.

17 Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu.

18 Dika I zigaram nime uwa, Mu onwem ziga-kwa-ra ha nime uwa.

19 N’ihi ha ka Mu onwem nēdo kwa Onwem nsọ, ka ewe do kwa ha onwe-ha nsọ n’ezi-okwu.

20 Ọ bughi kwa nání ndia ka M’nēkpe ekpere bayere ha, kama anamekpe kwa ekpere bayere ndi kwere na Mu site n’okwu-ha;

21 ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem.

22 Otuto nke I nyeworom ka Mu onwem nyewo-kwa-ra ha; ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu otù;

23 Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù; ka uwa we mara na Gi onwe-gi ziterem, na I hu-kwa-ra ha n’anya, dika I hurum n’anya.

24 Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n’ihi na I hurum n’anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa.

25 Nna Nke bu Onye ezi omume, uwa amaghi Gi, ma Mu onwem mara Gi; ndia ndia ma-kwara na Gi onwe-gi ziterem;

26 eme-kwa-ram ka ha mara aha-Gi, M’gēme kwa ka ha mara ya; ka ihu-n’anya I ji hum we di nime ha, Mu onwem kwa nime ha.

Categories
JỌN

JỌN 18

1 Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, Ọ pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, gabiga n’ofè iyi Kidron, ebe ubi ab͕ara ogige di, nke Ọ bàra nime ya, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya.

2 Ma Judas, onye nārara Ya nye, mata-kwa-ra ebe ahu: n’ihi na Jisus na ndi nēso uzọ-Ya zukọrọ n’ebe ahu ọtutu oge.

3 Ya mere Judas, ebe ọ natara òtù ndi-agha, na ndi nēje ozi site n’aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi, ọ chiri oriọna na ọwa na ihe-agha bia n’ebe ahu.

4 Ya mere Jisus, ebe Ọ matara ihe nile nābiakwasi Ya, Ọ pua, si ha, Ònye ka unu nāchọ?

5 Ha zara Ya, si, Jisus Onye Nazaret. Jisus siri ha, Mu onwem bu Ya. Ma Judas, onye nārara Ya nye, nēguzo kwa n’etiti ha.

6 Ya mere mb͕e Ọ siri ha, Mu onwem bu Ya, ha la azu, we da n’ala.

7 Ya mere Ọ juru ha ọzọ, si, Ònye ka unu nāchọ? Ha si, Jisus Onye Nazaret.

8 Jisus zara, si, Agwaram unu na Mu onwem bu Ya: ya mere ọ buru na unu nāchọm, ka ndia la:

9 ka okwu O kwuru we mezu, si, N’etiti ndi I nyeworom ọ dighi onye ọ bula M’tufuru.

10 Ya mere Saimon Pita, ebe o ji mma-agha, ọ miputa ya, b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya. Ma aha orù ahu bu Malkọs.

11 Ya mere Jisus siri Pita, Miye mma-agha-gi n’ọbọ-ya: iko nke Nnam nyeworom, M’gaghi-aṅu ya?

12 Ya mere òtù ndi-agha ahu na ọchi-agha, na ndi nējere ndi-Ju ozi, jidere Jisus ke kwa Ya ab͕u,

13 we buru uzọ duru Ya jekuru Anas; n’ihi na ya bu nna nwunye Kaiafas, onye bu onye-isi-nchu-àjà arọ ahu.

14 Ma Kaiafas bu onye ahu nke dururi ndi-Ju ọdú, na ọ bara urù ka otù onye nwua n’ọnọdu ndi-Ju.

15 Saimon Pita we so Jisus, ya na onye ọzọ nke nēso uzọ Jisus. Ma onye ahu nke nēso uzọ Jisus bu onye onye-isi-nchu-aja mara, o we so Jisus ba n’obí onye-isi-nchu-àjà;

16 ma Pita nēguzo n’èzí n’ọnu-uzọ. Ya mere onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye onye-isi-nchu-àjà mara, we pua gwa nwanyi nke nēche ọnu-uzọ okwu, we dubata Pita.

17 Ya mere nwa-ab͕ọghọ ahu nke nēche ọnu-uzọ si Pita, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye n’etiti ndi nēso uzọ Nwoke a? Pita si, Abughi m.

18 Ma ndi-orù na ndi nēje ozi guzoro n’ebe ahu, ebe ha funwusiri ọku icheku; n’ihi na oyi nātu; ha nānya kwa ọku: Pita nọ kwa n’etiti ha, nēguzo nānya kwa ọku.

19 Ya mere onye-isi-nchu-àjà juru Jisus ajuju bayere ndi nēso uzọ-Ya, na ajuju bayere ozizí-Ya.

20 Jisus zara ya, si, Mu onwem agwawawo uwa okwu; Mu onwem zíri ihe mb͕e nile n’ulo-nzukọ, na n’ulo uku Chineke, ebe ndi-Ju nile nāb͕akọ; ekwukwaghi m ihe ọ bula na nzuzo.

21 Gini mere i nāju Mu onwem? jua ndi nuworo okwum, ihe M’gwara ha: le, ndia matara ihe nile Mu onwem kwuru.

22 Ma mb͕e O kwusiri okwu ndia, otù onye nime ndi nēje ozi nke nēguzo nso we pia Jisus ihe, si, Ì nāza onye-isi-nchu-àjà otú a?

23 Jisus zara ya, si, Ọ buru na M’kwuru nke-ọjọ, b͕ara ihe ọjọ ahu àmà: ma ọ buru nke-ọma, gini mere i nētim aka?

24 Ya mere Anas zigara Ya n’ab͕u jekuru Kaiafas onye-isi-nchu-àjà.

25 Ma Saimon Pita nēguzo nānya kwa ọku. Ya mere ha siri ya, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya? Onye ahu gọrọ, si, Abughi m.

26 Otù onye nime ndi-orù onye-isi-nchu-àjà, buri onye-ikwu nke onye ahu Pita bipuru nti-ya, si, Mù onwem ahughi gi na Ya n’ubi ahu ab͕ara ogige?

27 Ya mere Pita gọ-kwa-ra ọzọ: ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa.

28 Ya mere ha si na nke Kaiafas duru Jisus ba na Pritoriọm: ọ bu kwa n’isi-ututu; ma ha onwe-ha abàghi nime Pritoriọm ahu, ka aghara imeru ha, kama ka ha we rie oriri ngabiga.

29 Ya mere Pailat pukuru ha n’èzí, si, Ọ̀ bu ebubo gini ka unu nēbo Nwoke a?

30 Ha zara, si ya, Ọ buru na Onye a abughi onye nēme ihe ọjọ, ayi agaghi-ararawori Ya nye n’aka-gi.

31 Ya mere Pailat siri ha, Unu onwe-unu were Ya, kpe-kwa-nu Ya ikpé dika iwu-unu si di. Ndi-Ju siri ya, O zighi ayi ezi n’iwu ib͕u onye ọ bula:

32 ka okwu Jisus we mezu, nke O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gajē inwu.

33 Ya mere Pailat bà-kwa-ra ọzọ nime Pritoriọm, we kpọ Jisus, si Ya, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju?

34 Jisus zara, si, Gì onwe-gi nēkwu nka n’onwe-gi, ma-ọbu na ndi ọzọ gwara gi okwu bayerem?

35 Pailat zara, si, Mù onwem bu onye-Ju? Mba nke Gi na ndi-isi-nchu-àjà rara Gi nye n’akam: gini ka I mere?

36 Jisus zara, si, Ala-ezem esiteghi n’uwa nka: ọ buru na ala-ezem sitere n’uwa nka, ndi nējerem ozi gālu ọ̀gù, ka aghara iraram nye n’aka ndi-Ju: ma ub͕u a ala-ezem esighi n’ebe a puta.

37 Ya mere Pailat siri Ya, Gì onwe-gi bu kwa eze? Jisus zara, si, Gi onwe-gi nāsi na Mu onwem bu eze. Amuwo Mu onwem ime ihe a, abiawokwam nime uwa ime ihe a, ka M’we b͕ara ezi-okwu àmà. Onye ọ bula nke sitere n’ezi-okwu ahu nānu olum.

38 Pailat si Ya, Gini bu ezi-okwu?

Mb͕e o kwusiri nka, o we pukuru ndi-Ju ọzọ, si ha, Mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya.

39 Ma unu nwere ome-n’ala, ka m’rapuru unu otù onye n’ememe ngabiga: ùnu nēzube kwa ka M’rapuru unu Eze ndi-Ju?

40 Ya mere ha tiri nkpu ọzọ, si, Ọ bughi Onye a, kama ọ bu Barabas. Ma Barabas bu onye nāpunara madu ihe.

Categories
JỌN

JỌN 19

1 Ya mere mb͕e ahu Pailat were Jisus, pia Ya ihe.

2 Ndi-agha we kpa okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n’isi, were kwa uwe odobo b͕okwasi Ya;

3 ha we nābiakute Ya, nāsi, Ekele, Eze ndi-Ju! ha nāpia kwa Ya ihe.

4 Pailat we pu kwa ọzọ n’èzí, si ha, Le, anamekuputa Ya n’èzí nye unu, ka unu we mara na ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya.

5 Ya mere Jisus putara n’èzí, nēkpu okpu-eze ahu nke eji ogwu me, nēyi kwa uwe odobo ahu. Pailat we si ha, Le, Nwoke ahu!

6 Ya mere mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi nēje ozi huru Ya, ha tie nkpu, si, Kpọgide Ya n’obe, kpọgide Ya n’obe. Pailat si ha, Unu onwe-unu were Ya, kpọgide kwa Ya n’obe: n’ihi na mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmhie nime Ya.

7 Ndi-Ju zara ya, si, Ayi onwe-ayi nwere iwu, ma dika iwu ahu si di O kwesiri inwu ọnwu, n’ihi na O mere Onwe-ya Ọkpara Chineke.

8 Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu a, ọ tukariri egwu;

9 o we ba nime Pritoriọm ọzọ, we si Jisus, Òle ebe Gi onwe-gi si bia? ma ọ dighi ọziza Jisus zara ya.

10 Ya mere Pailat si Ya, Ì dighi-agwam okwu? Ì mataghi na m’nwere ike irapu Gi, m’nwe-kwa-ra ike ikpọgide Gi n’obe?

11 Jisus zara ya, si, I gaghi-enwe ike ọ bula imegidem, ọ buru na esighi n’elu nye gi ya-ri: n’ihi nka onye raram nye n’aka-gi nwere nmehie kari.

12 Site na nka Pailat nāchọ uzọ irapu Ya: ma ndi-Ju tiri nkpu, si, Ọ buru na i rapu Onye a, i bughi eyì Sisa: onye ọ bula nke nēme onwe-ya eze nēkwu okwu imegide Sisa.

13 Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu ndia, o duputa Jisus n’èzí, we nọkwasi oche-ikpé n’ebe anākpọ Pavement, ma n’asusu Hibru, Gabata.

14 Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe nke ememe ngabiga: ọ di ka oge hour nke-isi. O we si ndi-Ju, Le, Eze-unu!

15 Ya mere ndi ahu tiri nkpu, si, Wepu Ya, wepu Ya, kpọgide Ya n’obe. Pailat si ha, M’gākpọgide Eze-unu n’obe? Ndi-isi-nchu-àjà zara, si, Ayi enweghi eze ma-ọbughi Sisa.

16 Ya mere mb͕e ahu ọ rara Ya nye n’aka-ha, ka ewe kpọgide Ya n’obe.

17 Ya mere ha kuru Jisus tiyere onwe-ha: O we pua, nēbu obe-Ya n’Onwe-ya, ga rue ebe anākpọ Ebe okpokoro-isi, nke anākpọ n’asusu Hibru Gọlgọta:

18 ebe ha kpọgidere Ya n’obe, Ya na ndikom abua ọzọ, otù n’akuku a otù n’akuku ọzọ, Jisus nọ kwa n’etiti ha.

19 Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n’elu obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU.

20 Ya mere ọtutu n’etiti ndi-Ju guru ihe-ndekwasi ahu: n’ihi na ebe akpọgidere Jisus n’obe di obodo Jerusalem nso: ede-kwa-ra ya n’asusu Hibru, n’asusu Latin, n’asusu Grik.

21 Ya mere ndi-isi-nchu-àjà nke ndi-Ju si Pailat, Edela, Eze ndi-Ju; kama, na Onye ahu siri, Abum Eze ndi-Ju.

22 Pailat zara, si, Ihe m’deworo, edewom ya.

23 Ya mere ndi-agha, mb͕e ha kpọgidesiri Jisus n’obe, ha chiri uwe-Ya, kè ha òkè anọ, otù onye otù òkè otù onye otù òkè; ha chi-kwa-ra uwe-ime-Ya: ma uwe-ime ahu enweghi ọb͕ub͕a, akpara ya site n’elu we gazu n’aru uwe-ime ahu dum.

24 Ya mere ha siritara onwe-ha, Ka ayi ghara idọwa ya, kama ka ayi fere ya nzà, onye ọ gābu nke ya: ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ we mezue, nke si,

Ha kère uwem nye onwe-ha,

N’elu ihe m’nēyi n’aru ka ha fe-kwa-ra nzà.

Ya mere ndi-agha ahu mere ihe ndia.

25 Ma nne-Ya, na nwa-nne nne-Ya nke nwayi, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalini, nēguzo obe Jisus nso.

26 Ya mere mb͕e Jisus huru nne-Ya, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Ọ huru n’anya, ka o nēguzo nso, Ọ si nne-Ya, Nwanyi, le, nwa-gi nwoke!

27 Mb͕e ahu Ọ si onye ahu nke nēso uzọ-Ya, Le, nne-gi! Site n’oge hour ahu onye ahu nke nēso uzọ-Ya we kuru ya la n’ulo nke aka ya.

28 Mb͕e ihe a gasri, Jisus, ebe Ọ matara na ihe nile agwuwo ub͕u a, ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ we mezu, Ọ si, Akpiri nākpọm nku.

29 Adọbara n’ebe ahu ite nke manya-vine b͕ara uka juru: ya mere ha were sponge nke manya-vine ahu b͕ara uka juru tukwasi n’elu osisi hyssop, che Ya n’ọnu.

30 Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.

31 Ya mere ndi-Ju, ebe ọ bu ubọchi Nkwadebe, ka aru-ha we ghara idigide n’elu obe n’ubọchi-izu-ike (n’ihi na ubọchi-izu-ike nke ízù ahu bu oké ubọchi), ha kpere Pailat ka etijie ogwe-ukwu-ha, ka ebupu kwa ha.

32 Ya mere ndi-agha biara, tijie ogwe-ukwu nke onye mbu, na nke onye ọzọ, nke akpọgidere Ya na ya n’obe:

33 ma mb͕e ha biaruru Jisus, hu kwa na Ọ nwuwori ub͕u a, ha etijighi ogwe-ukwu-Ya:

34 otú ọ di, otù onye n’etiti ndi-agha were ube ma Ya n’akuku, ngwa ngwa ọbara na miri we puta.

35 Onye huworo ya ab͕awo kwa àmà, àmà-ya bu kwa ezie: onye ahu nāmata kwa na o nēkwu ezi-okwu, ka unu onwe-unu we kwere kwa.

36 N’ihi na ihe ndia mere, ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ we mezu, Agaghi-etiji otù ọkpukpu-Ya.

37 Ọzọ kwa, ihe ọzọ di iche edeworo n’akwukwọ nsọ si, Ha gēlegide Onye ahu Nke ha mapúru amapú.

38 Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Josef nke Arimatia, ebe o nēso uzọ Jisus, ma na nzuzo n’ihi egwu ndi-Ju, o kpere Pailat ka o bupu aru Jisus: Pailat we kwere ya. Ya mere ọ biara, bupu aru-Ya.

39 Nikọdimọs, onye biakutere Ya n’abali na mbu, bia-kwa-ra, nēweta myrrh na aloes agwara, ihe ra ka ọgu pound ise n’ọtùtù.

40 Ya mere ha were aru Jisus, ke ya n’ezi ákwà-ozu, ya na udá utọ ndia, dika ndi-Ju nēme n’ilì ozu.

41 Ma n’ebe akpọgidere Ya N’obe otù ubi ab͕ara ogige di; nime ubi ab͕ara ogige ahu ílì ọhu di kwa nke akātọb͕ọghi madu ọ bula nime ya.

42 Ya mere n’ebe ahu, n’ihi ubọchi Nkwadebe nke ndi-Ju, (n’ihi na ílì ahu di nso), ka ha tọb͕ọrọ Jisus.

Categories
JỌN

JỌN 20

1 Ma n’ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa n’isi-ututu, mb͕e chi akābọghi, Meri Magdalini biaruru ílì ahu, we hu nkume-ya na ewepuwo ya n’ílì.

2 Ya mere ọ b͕a ọsọ, biakute Saimon Pita, biakute kwa onye ọzọ ahu nēso uzọ Jisus, onye Jisus huru n’anya, si ha, Ha ebupuwo Onye-nwe-ayi n’ílì, ayi amataghi kwa ebe ha tọb͕orọ Ya.

3 Ya mere Pita puru, ya na onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, ha we nēje iru ílì ahu.

4 Ha abua we b͕a ọsọ n’otù: onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus we b͕a kari Pita, buru uzọ biarue ílì ahu;

5 o we ruru ala nyo nime ya, hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ; otú ọ di, ọ bàghi nime.

6 Ya mere Saimon Pita bia kwa nēso ya, o we ba nime ílì ahu; o we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ,

7 ichafọ kwa, nke diri n’isi-Ya, ya na ezi ákwà-ozu ahu atọb͕ọghi n’otù ebe, kama aturuworo ya debe n’otù ebe di iche.

8 Ya mere mb͕e ahu onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye buru uzọ biarue ílì, bà-kwa-ra nime, o we hu, kwere kwa.

9 N’ihi na ha akāmataghi ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, na Ọ ghaghi isi na ndi nwuru anwu bilie.

10 Ya mere ndi ahu ndi nēso uzọ Jisus laghachiri ọzọ n’ulo nke aka ha.

11 Ma Meri nēguzo n’èzí na nso ílì ahu nākwa ákwá: ya mere, ka ọ nākwa, o ruru ala nyo nime ílì;

12 o we hu ndi-mọ-ozi abua nēyi uwe ọcha ka ha nọduru ala, otù n’isi, otù kwa n’ukwu, n’ebe atọb͕ọrọri aru Jisus.

13 Ndi ahu we si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? Ọ si ha, N’ihi na ha bupuru Onye-nwem, amatakwaghm ebe ha tọb͕ọrọ Ya.

14 Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o chigharia, we hu Jisus ka O guzoro, ma ọ mataghi na ọ bu Jisus.

15 Jisus si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? ònye ka i nāchọ? Nwanyi ahu, ebe ọ nēchè na Ọ bu onye-nche ubi ahu ab͕ara ogige, ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na Gi onwe-gi bupuru Ya, gwam ebe I tọb͕ọrọ Ya, mu onwem gēbupu kwa ya.

16 Jisus si ya, Meri. Nwayi ahu chigharia, si Ya n’asusu Hibru, Rabonai; nke bu, Onye-ozizí.

17 Jisus si ya, Emetulam aka; n’ihi na akāmarigogh lakuru Nnam: ma gakwuru umu-nnam, si ha, Anamarigo lakuru Nnam na Nna-unu, na Chinekem na Chineke-unu.

18 Meri Magdalini bia kọrọ ndi nēso uzọ-Ya, si, Ahuwom Onye-nwe-ayi; ọkọ-kwa-ra ha otú Ọ gwara ya-ri ihe ndia.

19 Ya mere mb͕e o ruru anyasi, n’ubọchi ahu, bú ubọchi mbu n’ízù, mb͕e emechi-kwa-ra uzọ nile ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, n’ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n’etiti, si ha, Udo diri unu.

20 Mb͕e O kwusiri nka, O gosi ha aka-Ya abua na akuku-Ya. Ya mere ndi nēso uzọ-Ya ṅuriri ọṅu, mb͕e ha huru Onye-nwe-ayi.

21 Ya mere Jisus siri ha ọzọ, Udo diri unu: dika Nnam ziteworom, otú a ka Mu onwem nēziga kwa unu.

22 Mgbe, ahu o kusa ha ume, si ha, Naranu Mọ Nsọ:

23 ndi nile ọ bula unu nāb͕aghara nmehie-ha, ab͕agharawo ha nye ha; ndi nile ọ bula unu nējide nmehie-ha, ejidewo nmehie-ha.

24 Ma Tomas, nke anākpọ Didimọs, otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, anọghi n’etiti ha mb͕e Jisus biara.

25 Ya mere ndi ọzọ nēso uzọ Jisus si ya, Ayi ahuwo Onye-nwe-ayi. Ma ọ siri ha, Ọ buru na ahughm n’aka-Ya abua apa ǹtú, tiye kwa nkpisi-akam n’apa ǹtú ahu, tiye kwa akam n’akuku-Ya, m’gaghi-ekwe ma-ọli.

26 Mb͕e ubọchi asatọ ọzọ gasiri ndi nēso uzọ Jisus we nọ nime ulo, Tomas nọ kwa n’etiti ha. Jisus bia, mb͕e emechiri uzọ nile, O guzo n’etiti ha, si, Udo diri unu.

27 Mb͕e ahu Ọ si Tomas, Setipu nkpisi-aka-gi n’ebe a, le akam abua; setipu kwa aka-gi, tiye nime akukum: aghọ-kwa-la onye nēkweghi, kama ghọ onye nēkwere.

28 Tomas zara, si Ya, Onye-nwem na Chinekem.

29 Jisus si ya, N’ihi na i huwom, ì kwerewo? ngọzi nādiri ndi akāhughi, ma ha kwere.

30 Ya mere ọtutu ihe-iriba-ama ọzọ ka Jisus mere n’iru ndi nēso uzọ-Ya, nke anēdeghi n’akwukwọ a:

31 ma edewo ihe ndia n’akwukwọ, ka unu we kwere na Jisus bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke; ka unu we nwe kwa ndu n’aha-Ya n’ihi na unu kwere.