Categories
JỌN

JỌN 1

1 Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke.

2 Onye ahu na Chineke diri na mbu.

3 Ekère ihe nile site n’aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya.

4 Nime Ya ka ndu diri; ndu ahu buru kwa Ìhè nke madu.

5 Ìhè ahu we nāmu n’ọchichiri; ọchichiri ahu ejideghi kwa ya.

6 Otù nwoke putara, onye ezitere site n’ebe Chineke nọ, aha-ya bu Jọn.

7 Onye ahu biara ib͕a àmà, ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà, ka madu nile we site n’aka-ya kwere.

8 Ya onwè-ya abughi Ìhè ahu, kama ọ biara ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà.

9 Ezi Ìhè ahu diri, Nke nēnye madu ọ bula nke nābia nime uwa ìhè.

10 Ọ nọri n’uwa, ekèkwara uwa site n’aka-Ya, uwa amaghi kwa Ya.

11 Ọ biakutere ihe nke aka Ya, ma ndi nke aka Ya akpọbataghi Ya.

12 Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n’aha-Ya:

13 ndi amuru, ọ bughi site n’ọbara, ọ bughi kwa site n’ọchichọ anu-aru, ọ bughi kwa site n’ọchichọ nwoke, kama site na Chineke.

14 Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n’etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n’aka nna-ya), O juputara n’amara na ezi-okwu.

15 Jọn nāb͕ara Ya àmà, nēti kwa nkpu, si, Onye a bu Onye m’kwuru okwu bayere Ya, si, Onye ahu Nke nābia n’azum aghọwo Onye burum uzọ: n’ihi na Ọ buri Onye mbu n’ebe m’nọ.

16 N’ihi na site na njuputa-Ya ka ayi onwe-ayi nile natara, ọbuná amara nēsochi amara.

17 N’ihi na esitere n’aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n’aka Jisus Kraist bia.

18 Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n’obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu.

19 Nka bu kwa àmà Jọn, mb͕e ndi-Ju siri na Jerusalem zigara ya ndi-nchu-àjà na ndi Livai ka ha jua ya, si, Gì onwe-gi bu onye?

20 O we kwuputa, ọ gọghi kwa agọ; ma o kwuputara, si, Mu onwem abughi Kraist ahu.

21 Ha we jua ya, si, Ì bu gini kwa? Gì onwe-gi bu Elaija? Ọ si, Abughi m. Gì onwe-gi bu onye-amuma ahu? O we za, si, É-è.

22 Ya mere ha siri ya, Ì bu onye? ka ayi we nye ndi zitere ayi ihe-ọziza. Ì si gini bayere onwe-gi?

23 Ọ siri, Mu onwem bu olu otù onye nēti nkpu n’ọhia, si, Menu uzọ Onye-nwe-ayi ka o guzozie ike, dika Aisaia onye-amuma kwuru.

24 Ma ufọdu nime ha ka ezitereri site n’etiti ndi-Farisi.

25 Ha we jua ya, si ya, Ọ̀ bu kwa gini mere i nēme baptism, ma ọ buru na gi onwe-gi abughi Kraist ahu, ma i bughi Elaija, ma i bughi onye-amuma ahu?

26 Jọn zara ha, si, Mu onwem nēji miri me baptism: n’etiti unu ka otù Onye nēguzo Nke unu onwe-unu nāmataghi,

27 bú Onye ahu Nke nābia n’azum, Onye mu onwem nēkwesighi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya.

28 Emere ihe ndia na Betani n’ofè Jọdan, ebe Jọn nēme baptism.

29 N’echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!

30 Onye a bu Onye mu onwem kwuru okwu bayere Ya, si, Otù Nwoke nābia n’azum Onye ghọworo Onye burum uzọ: n’ihi na Ọ buri Onye mbu n’ebe m’nọ.

31 Mu onwem amaghi kwa Ya; ma ka eme Ya ka Ọ puta ìhè nye Israel, n’ihi nka ka mu onwem biara nēji miri eme baptism.

32 Jọn we b͕a àmà, si, Ekiriwom Mọ Nsọ ka O si n’elu-igwe nēfeda ka nduru; O we nọgide n’aru Ya.

33 Mu onwem amaghi kwa Ya: ma Onye ziterem ka m’were miri me baptism, Onye ahu sirim, Onye ọ bula i gāhu Mọ Nsọ ka Ọ nēfedakwasi Ya, nānọgide kwa n’aru Ya, Onye ahu bu Onye nēji Mọ Nsọ eme baptism.

34 Mu onwem ahuwo kwa, b͕a kwa àmà na Onye a bu Ọkpara Chineke.

35 Ọzọ n’echi-ya Jọn guzoro, ya na madu abua nime ndi nēso uzọ-ya;

36 o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, Le, Nwa-aturu Chineke!

37 Madu abua ahu ndi nēso uzọ-ya we nu ka ọ nēkwu, ha we so Jisus.

38 Jisus we chigharia, kiri ha ka ha nēso Ya, Ọ si ha, Gini ka unu nāchọ? Ha we si Ya, Rabai (nke isi-ya bu, ma asugharia ya, Onye-ozizí), òle ebe I bi?

39 Ọ si ha, Bianu, unu gāhu kwa. Ya mere ha biara hu ebe O biri; ha na Ya we nọgide ubọchi ahu; ọ di ka oge hour nke-iri.

40 Otù nime madu abua ahu ndi nuru okwu si n’ọnu Jọn puta, ndi so-kwa-ra Ya, bu Andru, nwa-nne Saimon.

41 Onye ahu buru uzọ chọta nwa-nne nke aka ya, bú Saimon, si ya, Ayi ahuwo Mesaia-ayi (nke bu, ma asugharia ya, Kraist).

42 O duru ya biakute Jisus. Jisus lere ya anya, si, Gi onwe-gi bu Saimon nwa Jọn: agākpọ gi onwe-gi Kifas (nke bu Pita, ma asugharia ya).

43 N’echi-ya Ọ chọrọ ipu ga Galili, O we hu Filip: Jisus we si ya, Som.

44 Ma Filip bu onye Betsaida, onye si n’obodo Andru na Pita puta.

45 Filip we chọta Nataniel, si ya, Ayi ahuwo Onye Moses dere ihe bayere Ya n’akwukwọ iwu, Onye ndi-amuma dekwara ihe bayere Ya, Jisus Onye Nazaret, Nwa Josef.

46 Nataniel we si ya, Ọ̀ di ezi ihe ọ bula puru isi na Nazaret puta? Filip si ya, Bia le.

47 Jisus huru Nataniel ka ọ nābiakute Ya, O we kwue okwu bayere ya, si, Le, onye Israel n’ezie, onye aghughọ nādighi ya n’aru!

48 Nataniel si Ya, Òle ebe I maram? Jisus zara, si ya, Mb͕e Filip akākpọghi gi, mb͕e i nọ n’okpuru osisi fig, ahurum gi.

49 Nataniel zara Ya, si, Rabai, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke; Gi onwe-gi bu Eze Israel.

50 Jisus zara, si ya, N’ihi na M’siri gi, Ahurum i n’okpuru osisi fig, ì kwere ekwe? i gāhu ihe kariri ihe ndia uku.

51 Ọ si kwa ya, N’ezie, asim unu, Unu gāhu elu-igwe ka emegheworo ya, hu kwa ndi-mọ-ozi nke Chineke ka ha nārigo nārida kwa n’aru Nwa nke madu.

Categories
JỌN

JỌN 2

1 N’ubọchi nke-atọ ọlulu-nwunye di na Kena nke Galili; nne Jisus nọ kwa n’ebe ahu:

2 ewe kpọ kwa Jisus, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, bia n’ọlulu-nwunye ahu.

3 Mb͕e manya-vine kọrọ, nne Jisus we si Ya, Ha enweghi manya-vine.

4 Jisus we si ya, Nwanyi, gini ka Mu na gi nwekọrọ? oge hour nkem akābiarughi.

5 Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya.

6 Ma adọbara n’ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n’otù.

7 Jisus si ha, Were miri b͕ajue ite-miri ndia. Ha we b͕ajupu ha n’ọnu.

8 O we si ha, Kuputanu ub͕u a, bugara onye-isi oriri. Ha we būru ya.

9 Ma mb͕e onye-isi oriri ahu deturu miri ahu ọnu nke ghọrọri manya-vine, ma ọ mataghi ebe o si puta (ma ndi nēje ozi ndi kuputarari miri ahu mara), onye-isi oriri ahu we kpọ onye nālu nwunye ọhu,

10 si ya, Onye ọ bula nēbu uzọ adọba manya-vine ọma; mb͕e ọ bula madu ṅubigasiri manya ókè o we dọba nke jọkariri njọ: gi onwe-gi edebewo manya-vine ọma rue ub͕u a.

11 Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya.

12 Mb͕e ihe a gasiri Ọ ridara na Kapanaum, Ya onwe-ya, na nne-Ya, na umu-nne-Ya, na ndi nēso uzọ-Ya: ha we nọgide n’ebe ahu ọ bughi ọtutu ubọchi.

13 Ememe ngabiga nke ndi-Ju we di nso, Jisus we rigoro Jerusalem.

14 Ọ we hu n’ulo uku Chineke ndi nēre ehi na aturu na nduru, na ndi nāb͕anwe ego ka ha nọduru ala:

15 O we chiri udọ̀ me utari, we chupu ha nile n’ulo uku Chineke, ma aturu ma ehi ahu; Ọ wusì ego ndi nāb͕anwe ego, kpù kwa table-ha iru;

16 Ọ si ndi nēre nduru, Chipunu ihe ndi a n’ebe a; unu emela ulo Nnam ka ọ buru ulo ahia.

17 Ndi nēso uzọ-Ya chetara na edere ya-ri n’akwukwọ nsọ, si, Ekworo ulo-Gi gēripiam.

18 Ya mere ndi-Ju zara, si Ya, Ọ̀ bu ihe-iriba-ama gini ka I nēgosi ayi, ebe I nēme ihe ndia?

19 Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n’ubọchi atọ M’gēweli kwa ya elu.

20 Ya mere ndi-Ju siri, Ọgu arọ abua na isi ka eji wu ulo nsọ a, Gì onwe-gi gēweli kwa ya n’ubọchi atọ?

21 Ma Ya onwe-ya nēkwu okwu bayere ulo nsọ nke bu aru-Ya.

22 Ya mere mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ndi nēso uzọ-Ya chetara na O kwuru okwu a; ha we kwere ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, ya na okwu Jisus kwuru.

23 Ma mb͕e Ọ nọ na Jerusalem n’ememe ngabiga, n’ememe ahu, ọtutu madu kwere n’aha-Ya, n’ihi na ha nāhu ihe-iriba-ama-Ya nile nke Ọ nēme.

24 Ma Jisus onwe-ya araraghi Onwe-ya nye n’aka-ha na ntukwasi-obi, n’ihi na Ọ mara madu nile,

25 ya na n’ihi na ọ dighi Ya nkpà ka onye ọ bula b͕ara madu àmà; n’ihi na Ya onwe-ya mara ihe di nime madu.

Categories
JỌN

JỌN 3

1 Ma otù nwoke nime ndi-Farisi di aha-ya bu Nikọdimọs, otù onye-isi nke ndi-Ju:

2 Onye ahu biakutere Ya n’abali, si Ya, Rabai, ayi matara na I bu onye-ozizí Nke siworo n’ebe Chineke nọ bia: n’ihi na ọ dighi onye ọ bula puru ime ihe-iriba-ama ndia nke Gi onwe-gi nēme, ma ọ buru na Chineke anọyeghi ya.

3 Jisus zara, si ya, N’ezie, n’ezie, asi mi, Ọ buru na amughi madu ọzọ, ọ pughi ihu ala-eze Chineke anya.

4 Nikọdimọs we si ya, Èsi aṅa pu imu madu mb͕e ọ kara nká? ọ̀ puru ibà n’afọ nne-ya nke ub͕ò abua, ewe mua ya?

5 Jisus zara, N’ezie, n’ezie, asim i, Ọ buru na amughi madu site na miri na Mọ Nsọ, ọ pughi ibà n’ala-eze Chineke.

6 Nke amuworo site n’anu-aru bu anu-aru; nke amuwo-kwa-ra site na Mọ Nsọ bu mọ.

7 Ka ọ ghara iju gi anya na M’siri gi, Aghaghi imu unu ọzọ.

8 Ifufe nēfe ebe ọ nāchọ, i nānu kwa olu-ya, ma i mataghi ebe o si bia, na ebe ọ nāga: otú a ka onye ọ bula amuworo site na Mọ Nsọ di.

9 Nikọdimọs zara, si Ya, Ìhe ndia si aṅa pu ime?

10 Jisus zara, si ya, Gì onwe-gi bu onye-ozizí Israel, ma i maghi ihe ndia?

11 N’ezie, n’ezie, asim i, Ayi nēkwu ihe ayi matara, ayi nāb͕a kwa àmà ihe ayi huru; ma unu anaraghi àmà-ayi.

12 Ọ buru na agwaram unu ihe nke uwa, ma unu ekweghi, ùnu gēsi aṅa kwere, ma ọ buru na agwam unu ihe nke elu-igwe?

13 Ọ dighi kwa onye ọ bula rigoworo n’elu-igwe, ma-ọbughi Onye siri n’elu-igwe ridata, bú Nwa nke madu.

14 Ma dika Moses weliri agwọ n’ọhia, ọbuná otú a aghaghi iweli Nwa nke madu elu:

15 ka onye ọ bula nke kwere we nwe ndu ebighi-ebi na Ya.

16 N’ihi na Chineke huru uwa n’anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.

17 N’ihi na Chineke eziteghi Ọkpara-Ya n’uwa ka O kpe uwa ikpé; kama ka ewe site n’aka-Ya zọputa uwa.

18 Ekpeghi onye kwere na Ya ikpé: ekpewo onye nēkweghi na Ya ikpé ub͕u a, n’ihi na o kweghi n’aha nke Ọkpara Chineke muru nání Ya.

19 Ma nka bu ikpé ahu, na Ìhè ahu abiawo n’uwa, ma madu huru ọchichiri n’anya kama Ìhè ahu; n’ihi na ọlu-ha jọrọ njọ.

20 N’ihi na onye ọ bula nke nēme ihe nādighi nma nākpọ Ìhè ahu asì, ọ dighi-abiakute kwa Ìhè ahu, ka aghara itu ya ọlu-ya nile n’anya.

21 Ma onye nēme ihe bu ezi-okwu nābiakute Ìhè ahu, ka ewe me ka ọlu-ya puta ìhè, na aluworo ha na Chineke.

22 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus na ndi nēso uzọ-Ya biara n’ala Judia; n’ebe ahu ka Ya na ha nānọgide, Ọ nēme kwa baptism.

23 Jọn nēme kwa baptism n’Inon nke di Selem nso, n’ihi na miri riri nne n’ebe ahu: ha we nābia, anēme kwa ha baptism.

24 N’ihi na akātubàghi Jọn n’ulo-nkpọrọ.

25 Ya mere iju-ajuju putara n’etiti ndi nēso uzọ Jọn na onye-Ju banyere ime-ọcha.

26 Ha we biakute Jọn, si ya, Rabai, Onye gi na Ya nọ n’ofè Jọdan, Onye gi onwe-gi b͕aworo àmà nye Ya, le, Onye ahu nēme baptism, madu nile nābiakute kwa Ya.

27 Jọn zara, si, Madu apughi inata ihe ọ bula, ọ buru na eweghi ya nye ya site n’elu-igwe.

28 Unu onwe-unu nāb͕aram àmà, na m’siri, Mu onwem abughi Kraist ahu, kama, na ezitewom n’iru Ya.

29 Onye nwere nwunye ọhu bu onye nālu nwunye ọhu: ma enyì nke onye nālu nwunye ọhu, onye nēguzo nānu kwa okwu-ya, ọ nāṅuri ọṅu nke-uku n’ihi olu onye ahu nālu nwunye ọhu: ya mere emezuwo ọṅùm a.

30 Ya onwe-ya aghaghi idi nāba uba, ma aghaghm idi nāla alà.

31 Onye si n’elu bia ka ihe nile elu: onye si n’ala puta nāputa n’ala, si kwa n’ala nēkwu okwu: Onye si n’elu-igwe bia ka ihe nile elu.

32 Ihe nke ọ huworo na nke Ọ nuru, nka ka Ọ nāb͕a àmà; ma ọ dighi onye ọ bula nānara àmà-Ya.

33 Onye nara àmà-Ya kara akàrà-ya na nka, na Chineke bu Onye ezi-okwu.

34 N’ihi na Onye ahu Chineke zitere nēkwu okwu Chineke: n’ihi na O siteghi n’ọtùtù enye Mọ Nsọ.

35 Nna nāhu Ọkpara-Ya n’anya, O nyewo kwa Ya ihe nile n’aka.

36 Onye kwere n’Ọkpara ahu nwere ndu ebighi-ebi; ma onye nēkweyeghi Ọkpara ahu agaghi-ahu ndu, kama iwe Chineke nānọgide n’aru-ya.

Categories
JỌN

JỌN 4

1 Ya mere mb͕e Onye-nwe-ayi mara na ndi-Farisi nururi na Jisus nēme madu ka ha buru ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ nēme kwa ha baptism, kari Jọn,

2 (ọ bu ezie na Jisus onwe-ya emeghi baptism, kama ọ bu ndi nēso uzọ-Ya),

3 Ọ rapuru Judia, we je Galili ọzọ.

4 Ma Ọ ghaghi igabiga n’etiti Sameria.

5 Ya mere Ọ bia rue otù obodo nke Sameria, anākpọ Saika, na nso iberibe ala ahu nke Jekob nyere nwa-ya Josef:

6 ma isi-iyi Jekob di n’ebe ahu. Ya mere Jisus, ebe ike gwuru Ya n’ije-Ya, Ọ nọduru ala otú a n’usọ isi-iyi ahu. Ọ ra ka oge hour nke-isi.

7 Otù nwanyi, bú onye Sameria, bia isere miri: Jisus si ya, Nyem miri ka M’ṅua.

8 N’ihi na ndi nēso uzọ-Ya jeriri n’obodo izu nri.

9 Ya mere nwanyi Sameria ahu si Ya, Gì onwe-gi si aṅa ariọ miri n’akam ka I ṅua, ebe I bu Onye-Ju, ma mu bu nwanyi Sameria? (N’ihi na ndi-Ju na ndi Sameria adighi-emekọ ihe.)

10 Jisus zara, si ya, Ọ buru na i matara onyinye Chineke, na Onye Ọ bu Nke nāsi gi, Nyem miri ka M’ṅua; gi onwe-gi gāriọ Ya-ri, Ọ gēnye kwa gi miri di ndu.

11 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, I nweghi ihe isere miri, ma olùlù-miri a di omimi: òle ebe kwa ka I nwere miri ahu di ndu?

12 Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Jekob uku, onye nyere ayi olùlù-miri a; ya onwe-ya, na umu-ya, na anu-ulo-ya, ṅu-kwa-ra nime ya?

13 Jisus zara, si ya, Onye ọ bula nke nāṅu miri a, akpiri gākpọ ya nku ọzọ:

14 ma onye ọ bula nke gāṅu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebighi-ebi.

15 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, nyem miri a, ka akpiri we ghara ikpọm nku, ka m’ghara kwa isi n’ogologo uzọ a nile bia ebe a isere miri.

16 Jisus si ya, Laba, kpọ di-gi, bia kwa n’ebe a.

17 Nwanyi ahu zara, si Ya, Enweghm di. Jisus si ya, I kwuru nke-ọma, si, Enweghi m di:

18 n’ihi na i nwewo di ise; ma onye i nwere ub͕u a abughi di-gi: nka ka i kwuworo n’ezie.

19 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, ahurum na Gi onwe-gi bu onye-amuma.

20 Nna-ayi-hà nile kpọrọ isi ala nye Chineke n’ugwu a; ma unu onwe-unu si, na ebe madu aghaghi ikpọ isi ala nye Chineke di nime Jerusalem.

21 Jisus si ya, Nwanyi, kwerem, oge hour nābia, mb͕e unu nāgaghi-akpọ isi ala nye Nnam, ma ọ bu n’ugwu a, ma-ọbu na Jerusalem.

22 Unu onwe-unu nākpọ isi ala nye ihe unu nāmatagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi ala nye ihe ayi matara: n’ihi na nzọputa si n’etiti ndi-Ju puta.

23 Ma oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nākpọ isi ala n’ezie gākpọ isi ala nye Nnam nime mọ na ezi-okwu: n’ihi na ndi di otú ahu ka Nnam nāchọ kwa ka ha buru ndi nākpọ isi ala nye Ya.

24 Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghaghi ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu.

25 Nwanyi ahu si Ya, Amataram na Mesaia nābia (Onye anākpọ Kraist): mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, Ọ gākọrọ ayi ihe nile.

26 Jisus si ya, Mu onwem Nke nāgwa gi okwu bu Ya.

27 Mb͕e Ọ nēkwu nka ndi nēso uzọ-Ya biara; o we ju ha anya na Ya na nwanyi nēkwurita okwu: otú ọ di, o nweghi onye ọ bula siri, Gini ka I nāchọ? ma-ọbu, Gini mere Gi na ya nēkwurita okwu?

28 Ya mere nwanyi ahu rapuru ite-miri-ya, we je ba nime obodo, si ndi ahu,

29 Bianu, le otù Nwoke, Onye gwaram ihe nile m’mere: Ònye a gābu Kraist ahu?

30 Ha siri n’obodo-ha puta, nābiakute kwa Ya.

31 Mb͕e ihe ndia nēme ndi nēso uzọ-Ya nāriọ Ya, si, Rabai, rie ihe.

32 Ma Ọ siri ha, Mu onwem nwere ihe-oriri iri nke unu onwe-unu nāmataghi.

33 Ya mere ndi nēso uzọ-Ya sirita onwe-ha, Ọ̀ di onye wetara Ya ihe Ọ gēri?

34 Jisus si ha, Ihe-oririm bu ka M’nēme ihe Onye ziterem nāchọ, ka M’luzu kwa ọlu-Ya.

35 Ùnu onwe-unu asighi, Ọnwa anọ fọduru, owuwe-ihe-ubi ewe bia? le, asim unu, Welienu anya-unu elu, kiri ubi, na ha chara acha ub͕u a ka ewere ihe di nime ha.

36 Onye nēwere ihe ubi nānara ugwọ-ọlu-ya, nāchikọta kwa nkpuru nye na ndu ebighi-ebi; ka onye nāgha nkpuru na onye nēwere ihe ubi we ṅuria ọṅu n’otù.

37 N’ihi na nime nka ka okwu a bu ezie, Otù onye nāgha nkpuru, ma onye ọzọ nēwere ihe ubi.

38 Mu onwem zigara unu iwere ihe ubi nke ọ dighi mb͕e unu onwe-unu dọb͕uworo onwe-unu n’ilu ya: ndi ọzọ adọb͕uwo onwe-ha n’ọlu, unu onwe-unu abàwo kwa na ndọb͕u-ha.

39 Ma ọtutu ndi Sameria si n’obodo ahu kwere na Ya n’ihi okwu nwanyi ahu, onye b͕ara àmà, si, Ọ gwaram ihe nile m’mere.

40 Ya mere mb͕e ndi Sameria biakutere Ya, ha riọ Ya ka Ọ nọyere ha: O we nọgide n’ebe ahu ubọchi abua.

41 Ma ndi kwere n’ihi okwu-Ya kariri ri nne;

42 ha we si nwanyi ahu, Ọ bughi n’ihi ihe i kwuru ka ayi nēkwe ub͕u a: n’ihi na ayi onwe-ayi anuwo, mata kwa na Onye a bu Onye-nzọputa nke uwa n’ezie.

43 Ma mb͕e ubọchi abua ahu gasiri, O si n’ebe ahu pua ba na Galili.

44 N’ihi na Jisus onwe-ya b͕ara àmà, na adighi-asọpuru onye-amuma n’ala nke aka ya.

45 Ya mere mb͕e Ọ biara na Galili, ndi Galili nara Ya nke-ọma, ebe ha hururi ka ihe O mere na Jerusalem ra n’ememe: n’ihi na ha onwe-ha je-kwa-ra ememe ahu.

46 Ya mere Ọ biaruru Kena nke Galili ozọ, ebe O mere miri ka ọ ghọ manya-vine, Ma otù nwoke nke nējere eze ozi di, nke aru nādighi nwa-ya nwoke ike na Kapanaum.

47 Mb͕e onye ahu nuru na Jisus esiwo na Judia puta ba na Galili, o jekuru Ya, riọ Ya ka Ọ ridata, me ka aru di nwa-ya ike; n’ihi na ọ nọ n’ọnu ọnwu.

48 Ya mere Jisus siri ya, Ọ buru na unu ahughi ihe-iriba-ama na ọlu-ebube, unu agaghi-ekwe ma-ọli.

49 Nwoke ahu nke nējere eze ozi si Ya, Onye-nwe-ayi, ridata mb͕e nwatakirim akānwughi.

50 Jisus si ya, Ga nke gi; nwa-gi nwoke di ndu. Nwoke ahu kwere okwu Jisus gwara ya, o we ga nke ya.

51 Ma mb͕e ọ nọ nārida ub͕u a, ndi-orù-ya zutere ya, si, na nwa-ya di ndu.

52 Ya mere ọ juru ha oge hour nke aru-ya malitere idi ya nma. Ya mere ha siri ya, Nnyahuru n’oge hour nke-asa ka aru-ọku rapuru ya.

53 Ya mere nna-ya mara na ọ bu n’oge hour ahu mb͕e Jisus siri ya, Nwa-gi nwoke di ndu: ya onwe-ya we kwere na èzí-na-ulo-ya dum.

54 Nka bu ihe-iriba-ama ọzọ nke mere ha abua nke Jisus mere, mb͕e O siri na Judia puta ba na Galili.

Categories
JỌN

JỌN 5

1 Mb͕e ihe ndia gasiri otù ememe nke ndi-Ju di; Jisus we rigoro Jerusalem.

2 Ma ọdọ-miri ntà di na Jerusalem n’akuku ọnu-uzọ-ama nke aturu, nke anākpọ n’asusu Hibru Betesda, nke nwere ulo-ìbà ise.

3 Nime ndia ka ìgwè madu ndi aru-ha nādighi ike nēdina, ndi-ìsì, ndi-ngwurọ ndi akuku-aru-ha kpọnwuru akpọnwu, [nēche uṅarà nke miri ahu.

4 N’ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nāridata n’ọdọ-miri ntà ahu n’oge ufọdu, we kpasue miri ahu: ya mere onye buru uzọ ba nime ya mb͕e akpasusiri miri ahu, eme ka aru di ya nma, n’ọria ọ bula jidere ya.]

5 Ma otù nwoke nọ n’ebe ahu, onye nọri orú arọ na iri na asatọ na nriaria-ya.

6 Mb͕e Jisus huru onye a ka o nēdina, ebe Ọ ma-kwa-ra na ọ nọri ogologo oge n’ọnọdu ahu, Ọ si ya, Ì nāchọ ka eme ka aru di gi nma?

7 Onye ahu aru nādighi ike zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, enweghm madu, ka ọ tubàm n’ọdọ-miri ntà nka, mb͕e ọ bula akpasuru miri: ma mb͕e mu onwem nọ nābia, onye ọzọ eburum uzọ rida.

8 Jisus si ya, Bilie, chiri ute-gi, nējeghari.

9 Ngwa ngwa ewe me ka aru di nwoke ahu nma, o we chiri ute-ya, we nējeghari.

Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n’ubọchi ahu.

10 Ya mere ndi-Ju nāsi onye ahu emere ka aru-ya di ike, Ọ bu ubọchi-izu-ike, o zighi kwa ezi n’iwu ka i chiri ute-gi.

11 Ma ọ zara ha, si, Onye mere ka aru dim nma, onye ahu sirim, Chiri ute-gi, nējeghari.

12 Ha juru ya, si, Ònye bu Madu ahu Nke siri gi, Chiri ute-gi nējeghari?

13 Ma onye ahu emere ka aru di ya ike amataghi Onye ọ bu: n’ihi na Jisus wezugarari Onwe-ya, n’ihi na ìgwè madu di n’ebe ahu.

14 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus chọputara ya n’ulo uku Chineke, si ya, Le, emewo ka aru di gi nma: emehiela ọzọ, ka ihe jọkariri njọ ghara ime gi.

15 Nwoke ahu jere, gwa ndi-Ju na ọ bu Jisus mereri ka aru di ya nma.

16 N’ihi nka ka ndi-Ju nēsob͕u kwa Jisus, n’ihi na Ọ nēme ihe ndia n’ubọchi-izu-ike.

17 Ma Jisus zara ha, si, Nnam nālu ọlu rue ub͕u a, Mu onwem nālu kwa ọlu.

18 Ya mere n’ihi nka ka ndi-Ju nāchọ kari uzọ ib͕u Ya, n’ihi na ọ bughi nání na Ọ nēmebi ubọchi-izu-ike, kama Ọ nākpọ kwa Chineke Nna nke aka Ya, nēme ka Ya onwe-ya na Chineke ra.

19 Ya mere Jisus zara, si ha,

N’ezie, n’ezie asim unu, Ọkpara apughi ime ihe ọ bula n’Onwe-ya, ma-ọbughi ihe Ọ huru na Nna-Ya nēme: n’ihi na ihe ọ bula Ya onwe-ya nēme, ndia ka Ọkpara-Ya nēme kwa otú ahu.

20 N’ihi na Nnam nāhu Ọkpara-Ya n’anya, nēgosi kwa Ya ihe nile Ya onwe-ya nēme: oké ọlu kari ndia ka Ọ gēgosi kwa Ya, ka o we ju unu onwe-unu anya.

21 N’ihi na dika Nnam nēme ndi nwuru anwu ka ha si n’ọnwu bilie, dika Ọ nēme kwa ka ha di ndu, otú a ka Ọkpara-Ya nēme kwa ka ndi Ọ nāchọ di ndu.

22 N’ihi na Nnam adighi-ekpe kwa madu ọ bula ikpé, kama O werewo ikpé nile nye Ọkpara-Ya;

23 ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya.

24 N’ezie, n’ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n’ikpé, kama o sitewo n’ọnwu ba na ndu.

25 N’ezie, n’ezie, asim unu, Oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nwuru anwu gānu olu Ọkpara Chineke; ndi nuru gādi kwa ndu.

26 N’ihi na dika Nnam nwere ndu nime Onwe-ya, otú a ka O nye-kwa-ra Ọkpara-Ya inwe ndu nime Onwe-ya:

27 O nye-kwa-ra Ya ike ilu ọlu ikpé, n’ihi na Ọ bu Nwa nke madu.

28 Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge hour nābia mb͕e ndi nile di n’ílì gānu olu-Ya,

29 ha gāputa kwa; ndi mere ezi ihe gābà na nbilite-n’ọnwu nke ndu; ma ndi mere ihe nādighi nma gābà na nbilite-n’ọnwu nke ikpé.

30 Mu onwem apughi ime ihe ọ bula n’Onwem: dika M’nānu M’nēkpe: ikpem zi-kwa-ra ezi; n’ihi na etughi m ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Onye ziterem nāchọ.

31 Ọ buru na Mu onwem ab͕ara Onwem àmà, àmàm abughi ezie.

32 Ọ bu onye ọzọ nab͕aram àmà; amata-kwa-ram na àmà nke Ọ nāb͕aram bu ezie.

33 Unu onwe-unu ezigaworo Jọn, ọ b͕awo-kwa-ra ezi-okwu ahu àmà.

34 Ma àmà nke Mu onwem nānara esighi n’ọnu madu puta: otú ọ di, ihe ndia ka M’nēkwu, ka ewe zọputa unu.

35 Onye ahu bu oriọna ahu nke nēre ere nenwu kwa: unu onwe-unu chọ-kwa-ra ka obi tọ unu ụtọ nke-uku n’ìhè-ya nwa oge.

36 Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n’ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M’luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M’nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom.

37 Nna nke ziterem, Ya onwe-ya ab͕awo-kwa-ram àmà. Ọ dighi mb͕e ọ bula unu nuworo olu-Ya, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula unu huworo oyiyi-Ya.

38 Unu enweghi kwa okwu-Ya ka ọ nọgide nime unu: n’ihi na Onye Ya onwe-ya zitere, Onye ahu ka unu onwe-unu nēkweghi

39 Unu nēnyocha ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, n’ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà;

40 unu achọghi kwa ibiakutem, ka unu we nwe ndu.

41 Anaraghi m otuto n’aka madu.

42 Ma amaram unu, na unu enweghi ihu-n’anya Chineke nime onwe-unu.

43 Mu onwem abiawo n’aha Nnam, ma unu anaraghm: ọ buru na onye ọzọ gābia n’aha nke aka ya, onye ahu ka unu gānara.

44 Ùnu onwe-unu si aṅa pu ikwe, ebe unu nānara otuto n’aka ibe-unu, ma otuto nke si n’aka Onye ahu Nke nání Ya bu Chineke bia unu achọghi?

45 Unu echèla na Mu onwem gēbo unu ebubo n’iru Nnam: otù onye di nēbo unu ebubo, bú Moses, onye unu onwe-unu tukwasiworo obi-unu na ya.

46 N’ihi na ọ buru na unu kwere Moses, unu gēkwem; n’ihi na ya onwe-ya dere ihe bayerem n’akwukwọ.

47 Ma ọ buru na unu ekweghi ihe onye ahu dere n’akwukwọ, ùnu gēsi aṅa kwere okwu nkem?

Categories
JỌN

JỌN 6

1 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus jere n’ofè ọzọ nke oké osimiri Galili, nke bu osimiri Taibirias.

2 Oké ìgwè madu we so Ya, n’ihi na ha huru ihe-iriba-ama di iche iche nke Ọ nēme n’aru ndi aru-ha nādighi ike.

3 Jisus we rigo n’ugwu ahu, n’ebe ahu ka Ya na ndi nēso uzọ-Ya nọdu-kwa-ra ala.

4 Ma ngabiga, bú ememe ndi-Ju, di nso.

5 Ya mere Jisus, mb͕e O weliri anya-Ya elu, hu na oké ìgwè madu nābiakute Ya, Ọ si Filip, Òle ebe ayi gāzuta ob͕e achicha, ka ndia we rie ihe?

6 Ma nka ka O kwuru inwa ya: n’ihi na Ya onwe-ya matara ihe Ọ gāje ime.

7 Filip zara Ya, Ob͕e achicha ọgu shilling iri agaghi-ezu ha, ka madu nile n’otù we were nke-ntà nke-ntà.

8 Otù nime ndi nēso uzọ-Ya, bú Andru nwa-nne Saimon Pita, si Ya,

9 Otù nwa-okoro ntà nọ n’ebe a, onye ji ob͕e achicha barley ise, na azù abua: ma ǹdia bu gini n’etiti ọtutu madu di otú a?

10 Jisus siri, Menu ka madu ndia nọdu ala. Ma ahihia riri nne n’ebe ahu. Ya mere ndikom ahu we nọdu ala, n’ọnu-ọgugu ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri.

11 Ya mere Jisus nara ob͕e achicha ise ahu, we kele, we kèsa ha nye ndi nānọdu ala; otú ahu O were azù ahu kèsa nye ha ka azù ha chọrọ ra.

12 Ma mb͕e afọ juru ha, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Chikọtanu iberibe fọduru, ka ihe ọ bula ghara ila n’iyì.

13 Ya mere ha chikọtara ha, we kpoju nkata iri na abua n’iberibe sitere n’ob͕e achicha barley ise ahu, nke fọduru ndi riworori.

14 Ya mere mb͕e ndi ahu huru ihe-iriba-ama O mere, ha siri, N’ezie Onye a bu onye-amuma ahu nke nābia n’uwa.

15 Ya mere mb͕e Jisus huru na ha gaje ibia idọkpuru Ya n’ike, ka ha we me Ya eze, O wezugara Onwe-ya ọzọ n’ugwu nání Ya onwe-ya.

16 Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya ridara n’oké osimiri;

17 ha we ba n’ub͕ọ, we nāgabiga ofè oké osimiri ọzọ iga ru Kapanaum. Ọchichiri ab͕awo-kwa-ri ub͕u a, Jisus akābiakuteghi kwa ha.

18 Oké osimiri nēbili kwa, n’ihi na oké ifufe nēfe.

19 Ya mere mb͕e ha nyasiri ihe dika orú furlong na ise ma-ọbu orú na iri, ha hu Jisus ka Ọ nēje ije n’elu oké osimiri, nābiaru kwa ub͕ọ-ha nso: ha we tua egwu.

20 Ma Ọ siri ha, Ọ bu Mu onwem; unu atula egwu.

21 Ya mere ha chọrọ iwebata Ya nime ub͕ọ-ha: ngwa ngwa ub͕ọ-ha we rue ala ebe ha nāga.

22 N’echi-ya, ìgwè madu ndi guzoro n’ofè ọzọ nke oké osimiri ahu huru na ub͕ọ ntà ọzọ adighi n’ebe ahu, ma-ọbughi otù, hu kwa na Jisus esoghi ndi nēso uzọ-Ya ba n’ub͕ọ-ha, kama na nání ndi nēso uzọ-Ya jere;

23 (otú ọ di, ub͕ọ ntà di iche iche sitere na Taibirias bia rue ebe ahu nso ebe ha riri achicha ahu mb͕e Onye-nwe-ayi kelesiri ekele):

24 ya mere mb͕e ìgwè madu ahu huru na Jisus anọghi n’ebe ahu, na ndi nēso uzọ-Ya anọghi kwa, ha onwe-ha bàra n’ub͕ọ ntà, we bia Kapanaum, nāchọ Jisus.

25 Mb͕e ha chọputara Ya n’ofè oké osimiri ọzọ, ha si Ya, Rabai, òle mb͕e I biara n’ebe a?

26 Jisus zara ha, si, N’ezie, n’ezie, asi m unu, Unu nāchọm, ọ bughi n’ihi na unu huru ihe-iriba-ama kama ọ bu n’ihi na unu riri ufọdu nime ob͕e achicha ahu, afọ ju kwa unu.

27 Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n’iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n’ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà.

28 Ya mere ha siri Ya, Gini kwesiri ka ayi me, ka ayi we lua ọlu Chineke nile?

29 Jisus zara, si ha, Nka bu ọlu Chineke, ka unu kwere n’Onye ahu Ya onwe-ya zitere.

30 Ya mere ha siri Ya, Gini kwa ka Gi onwe-gi nēme ka ọ buru ihe-iriba-ama, ka ayi we hu, kwere kwa Gi? gini ka I nālu?

31 Nna-ayi-hà riri manna n’ọhia; dika edeworo n’akwukwọ nsọ, si, Nri nke sitere n’elu-igwe ka O nyere ha ka ha rie.

32 Ya mere Jisus siri ha, N’ezie, n’ezie, asim unu, Ọ bughi Moses nyere unu nri ahu nke sitere n’elu-igwe; kama ọ bu Nnam nēnye unu ezi nri ahu nke sitere n’elu-igwe.

33 N’ihi na nri nke Chineke bu nke ahu nke nēsi n’elu-igwe aridata, nke nēnye kwa uwa ndu.

34 Ya mere ha siri Ya, Onye-nwe-ayi, nye ayi nri a mb͕e nile.

35 Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula.

36 Ma asirim unu, na unu ahuwom, ma unu ekweghi.

37 Ihe nile nke Nnam nēnyem gābiakutem; onye nābiakutekwam M’gaghi-achupu ya ma-ọli.

38 N’ihi na esiwom n’elu-igwe ridata, ọ bughi ka M’nēme ihe Mu onwem nāchọ, kama ka M’nēme ihe Onye ziterem nāchọ.

39 Ma nka bu ihe Onye ziterem nāchọ, ka M’ghara itufu ihe ọ bula nime ihe nile O nyeworo m, kama ka M’me ka o si n’ọnwu bilie n’ubọchi ikpe-azu.

40 N’ihi na nka bu ihe Nnam nāchọ, ka onye ọ bula nke nēle Ọkpara-Ya anya, nke nēkwere kwa na Ya, we nwe ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n’ọnwu bilie n’ubọchi ikpe-azu.

41 Ya mere ndi-Ju nātamu ntamu megide Ya, n’ihi na Ọ siri, Mu onwem bu nri nke siri n’elu-igwe ridata.

42 Ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Jisus, Nwa Josef, Onye ayi onwe-ayi mara nna-Ya na nne-Ya? Ò si aṅa kwue ub͕u a, Esiwom n’elu-igwe ridata?

43 Jisus zara, si ha, Unu atamula n’etiti onwe-unu.

44 Ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na Nna Nke ziterem adọghi ya: Mu onwem gēme kwa ka o si n’ọnwu bilie n’ubọchi ikpe-azu.

45 Edewo ya n’akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n’ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem.

46 Ọ bughi na madu ọ bula ahuwo Nnam, ma-ọbughi Onye ahu Nke si n’ebe Chineke nọ puta, Onye ahu ahuwo Nnam.

47 N’ezie, n’ezie, asim unu, Onye nēkwere nēnwe ndu ebighi-ebi.

48 Mu onwem bu nri nke nēnye ndu.

49 Nna-unu-hà riri manna ahu n’ọhia, ha we nwua.

50 Nka bu nri nke si n’elu-igwe ridata, ka madu we rie ufọdu nime ya, ghara kwa inwu anwu.

51 Mu onwem bu nri di ndu nke siri n’elu-igwe ridata: ọ buru na madu erie ufọdu nime nri a, ọ gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: ma nri nke Mu onwem gēnye kwa bu anu-arum, n’ihi ndu nke uwa.

52 Ya mere ndi-Ju nālurita uka n’etiti onwe-ha, si, Onye a, Ò si aṅa pu inye ayi anu-aru-Ya ka ayi rie?

53 Ya mere Jisus siri ha, N’ezie, n’ezie, asim unu, Ọ buru na unu erighi anu-aru nke Nwa nke madu, ọ buru kwa na unu aṅughi ọbara-Ya, unu enweghi ndu nime onwe-unu.

54 Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, o nwere ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n’ọnwu bilie n’ubọchi ikpe-azu.

55 N’ihi na anu-arum bu ihe-oriri n’ezie, ọbaram bu kwa ihe-ọṅuṅu n’ezie.

56 Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, ọ nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya.

57 Dika Nna Nke di ndu ziterem, dika Mu onwem di kwa ndu n’ihi Nnam; otú a onye nērim, onye ahu gādi kwa ndu n’ihim.

58 Nka bu nri ahu nke siri n’elu-igwe ridata: ọ bughi dika nna-unu-hà riri, we nwua: onye nēri nri a gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

59 Ihe ndia ka O kwuru n’ulo-nzukọ, mb͕e O nēzí ihe na Kapanaum.

60 Ya mere ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e ha nuru okwu ahu, ha siri, Okwu a di ike; ònye puru inu ya?

61 Ma ebe Jisus mara n’Onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya nātamu ntamu n’ihi nka, Ọ siri ha, Ọ̀ bu nka nēme ka unu ma n’ọnyà?

62 Ùnu agaghi-amakari kwa n’ọnyà ma ọ buru na unu ahu Nwa nke madu ka Ọ nārigo n’ebe Ọ nọri na mbu?

63 Ọ bu Mọ nēme ka madu di ndu; anu-aru abaghi urù ọ bula: okwu nke Mu onwem gwaworo unu, ha bu mọ, buru kwa ndu.

64 Ma ufọdu ndi nēkweghi di n’etiti unu. N’ihi na Jisus mara site na mbu ndi ha bu ndi nēkweghi, na onye ọ bu nke gārara Ya nye.

65 O we si, Ọ bu n’ihi nka ka M’siworo unu, na ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na enyeghi ya site n’aka Nnam.

66 Site na nka ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya we laghachi azu, ha esoghi kwa Ya ejeghari ọzọ.

67 Ya mere Jisus siri ndi-ozi iri na abua ahu, Ùnu onwe-unu nāchọ kwa ila?

68 Saimon Pita zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, Ònye ka ayi gējekuru? I nwere okwu nke ndu ebighi-ebi.

69 Ọzọ, ayi onwe-ayi ekwerewo mara kwa na Gi onwe-gi bu Onye Nsọ ahu nke Chineke.

70 Jisus zara ha, si, Ọ̀ bughi Mu onwem rọputara unu, bú ndi-ozi iri na abua, ma otù onye nime unu bu nwa ekwensu?

71 Ma Ọ nēkwu ihe bayere Judas nwa Saimon Iskariot, n’ihi na onye ahu gaje irara Ya nye, buri otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu.

Categories
JỌN

JỌN 7

1 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus we nējeghari na Galili: n’ihi na Ọ chọghi ijeghari na Judia, n’ihi na ndi-Ju nāchọ uzọ ib͕u Ya.

2 Ma ememe ahu nke ndi-Ju, bú ememe ulo-ikwū, di nso.

3 Ya mere umu-nne-Ya siri Ya, Si n’ebe a pua, je na Judia, ka ndi nēso uzọ-Gi we hu kwa ọlu-Gi nile nke I nālu.

4 N’ihi na ọ dighi onye ọ bula nēme ihe ọ bula na nzuzo, ma asi na ya onwe-ya nāchọ ka ọra madu mara ya. Ọ buru na I nēme ihe ndia, me Onwe-gi ka I puta ìhè nye uwa.

5 N’ihi na ọbuná umu-nne-Ya ekweghi na Ya.

6 Ya mere Jisus si ha, oge nkem akērughi; ma oge nke unu bu ihe edoziworo mb͕e nile.

7 Uwa apughi ikpọ unu asì; ma ọ nākpọ Mu onwem asì, n’ihi na Mu onwem nāb͕ara ya àmà, na ọlu-ya nile jọrọ njọ.

8 Rigonu onwe-unu n’ememe a: Mu onwem agaghi-arigoro ememe a ub͕u a; n’ihi na oge nkem akēzughi.

9 Ma mb͕e Ọ gwasiri ha okwu ndia, Ọ nānọgide na Galili.

10 Ma mb͕e umu-nne-Ya rigosiri ememe ahu, mb͕e ahu Ya onwe-ya rigo-kwa-ra, ọ bughi n’iru ọra madu, kama dika ọ bu na nzuzo.

11 Ya mere ndi-Ju nāchọ Ya n’ememe, nāsi, Òle ebe Onye ahu nọ?

12 Oké ntamu di kwa n’etiti ìgwè madu nile bayere Ya: ufọdu nāsi, Ọ bu ezi madu; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama Ọ nēduhie ìgwè madu a.

13 Otú ọ di, ọ dighi onye ọ bula nēkwuwa okwu bayere Ya n’ihi egwu ndi-Ju.

14 Ma mb͕e o ruru n’etiti ememe ahu ub͕u a Jisus rigoro n’ulo uku Chineke, we nēzí ihe.

15 Ya mere o nēju ndi-Ju anya, ha si, Onye a, Ò si aṅa mata akwukwọ ri nne, n’ebe ọ dighi mb͕e Ọ muworo akwukwọ?

16 Ya mere Jisus zara ha, si, Ozizím abughi nkem, kama ọ bu nke Onye ziterem.

17 Ọ buru na onye ọ bula achọ ime ihe Ọ nāchọ, ọ gāmara ihe ozizí a bu, ma o sitere n’aka Chineke, ma-ọbu na Mu onwem nēkwu site n’Onwem.

18 Onye nēkwu site n’onwe-ya nāchọ otuto nke aka ya: ma onye nāchọ otuto nke onye zitere ya, onye ahu bu onye ezi-okwu, ajọ omume adighi kwa nime ya.

19 Ọ̀ bughi Moses nyere unu iwu-unu, ma ọ dighi onye ọ bula nime unu nēme iwu ahu? Gini mere unu nāchọ uzọ ib͕um?

20 Ìgwè madu ahu zara, si, I nwere mọ ọjọ: ònye nāchọ uzọ ib͕u Gi?

21 Jisus zara, si ha, Otù ọlu ka M’luru, o we nēju unu nile anya.

22 Ọ bu n’ihi nka ka Moses nyere unu ibì-úgwù (ọ bughi na o sitere n’aka Moses, kama o sitere n’aka nna-ayi-hà); n’ubọchi-izu-ike unu nēbì kwa madu úgwù.

23 Ọ buru na ebì madu úgwù n’ubọchi-izu-ike, ka ewe ghara imebi iwu Moses; ùnu nwere òlùlù ọjọ n’arum, n’ihi na emerem ka aru dichasia otù madu nma n’ubọchi-izu-ike?

24 Unu elela iru kpe ikpé, kama nēkpenu ikpé ziri ezi.

25 Ya mere ufọdu nime ndi Jerusalem siri, Onye a, Ọ̀ bughi Onye ha nāchọ uzọ ib͕u?

26 Ma le, Ọ nēkwuwa okwu, ma ha agwaghi Ya okwu ọ bula. Ọ̀ gābu na ndi-isi mara n’ezie na Onye a bu Kraist-ayi?

27 Otú ọ di ayi matara Onye a ebe O si puta: ma mb͕e ọ bula Kraist-ayi gābia, ọ dighi onye ọ bula mara ebe O si puta.

28 Ya mere Jisus tiri nkpu n’ulo uku Chineke, nēzí ihe, nāsi kwa, Unu mataram, mata kwa ebe M’si puta; ọ bughi kwa n’Onwem ka M’biaworo, kama Onye ziterem bu ezi Onye, Nke unu onwe-unu nāmataghi.

29 Mu onwem matara Ya; n’ihi na esim n’ebe Ọ nọ bia, Ya onwe-ya zite-kwa-ram.

30 Ya mere ha chọrọ uzọ ijide Ya: ọ dighi kwa onye ọ bula tukwasiri Ya aka, n’ihi na oge hour Ya akābiaghi.

31 Ma n’etiti ìgwè madu ahu ọtutu kwere na Ya; ha nāsi kwa, Mb͕e ọ bula Kraist-ayi gābia, Ọ̀ gēme ihe-iriba-ama kari nke Onye a mere?

32 Ndi-Farisi nuru ìgwè madu ahu ka ha nātamu ntamu ndia bayere Ya; ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi we ziga ndi nējere ha ozi ka ha jide Ya.

33 Ya mere Jisus siri, Ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ, M’we lakuru Onye ziterem.

34 Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia.

35 Ya mere ndi-Ju siritara onwe-ha, Òle ebe Onye a gaje iga na ayi onwe-ayi agaghi-achọta Ya? Ọ̀ gaje igakuru ndi b͕asara n’etiti ndi-Grik na izí ndi-Grik ihe?

36 Gini bu okwu a nke O kwuru, si, Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia?

37 Ma n’ubọchi ikpe-azu, bú oké ubọchi nke ememe ahu, Jisus guzoro, we tie nkpu, si, Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku, ya biakutem, ṅua miri.

38 Onye nēkwere na Mu, dika ihe edeworo n’akwukwọ nsọ kwuru, n’afọ-ya ka osimiri nke miri di ndu gēsi nērùputa.

39 Ma nka ka O kwuru bayere Mọ Nsọ, Nke ndi kwere na Ya gaje inara: n’ihi na akēnyeghi Mọ Nsọ; n’ihi na akēnyeghi Jisus otuto.

40 Ya mere ufọdu nime ìgwè madu ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia, ha si, N’ezie Onye a bu onye-amuma ahu.

41 Ndi ọzọ nāsi, Onye a bu Kraist-ayi. Ma ufọdu nāsi, Gini, ọ̀ gābu na Galili ka Kraist-ayi si bia?

42 Àkwukwọ nsọ ekwughi na Kraist-ayi nēsi na nkpuru Devid bia, site kwa na Betlehem, bú obodo ntá ebe Devid nọri?

43 Ya mere nkewa putara n’etiti ìgwè madu ahu n’ihi Ya.

44 Ma ufọdu nime ha chọrọ ijide Ya; ma ọ dighi onye ọ bula tukwasiri Ya aka.

45 Ya mere ndi ahu ndi nēje ozi biakutere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi; ndi ahu we si ha, N’ìhi gini ka unu nēkutaghi Ya?

46 Ndi ahu ndi nēje ozi zara, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula madu kwuru okwu di otú a.

47 Ya mere ndi-Farisi zara ha, si, Èduhiewo kwa unu onwe-unu?

48 Ọ̀ di onye ọ bula n’etiti ndi-isi, ma-ọbu n’etiti ndi-Farisi, kwere na Ya?

49 Ma ìgwè madu a nke nāmaghi iwu-ayi bu ndi anābu ọnu.

50 Nikọdimọs si ha (onye biakutere Ya na mbu, ebe ọ bu otù onye nime ha),

51 Ìwu-ayi nēkpe madu ikpé, ọ buru na o bughi uzọ nu n’ọnu-ya, we mara ihe ọ nēme?

52 Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n’akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie.

53 Ha nile we la, onye ọ bula n’ulo nke aka ya:

Categories
JỌN

JỌN 8

1 ma Jisus gara ugwu Olive.

2 O we bia kwa ọzọ n’isi-ututu n’ulo uku Chineke, ndi-Ju nile we biakute Ya; O we nọdu ala, we nēzí ha ihe.

3 Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we kuta otù nwanyi nke ejidereri n’ikwa-iko; mb͕e ha guzosiri ya n’etiti,

4 ha we si Ya, Onye-ozizí, ejidewo nwanyi a n’ikwa-iko, mb͕e ọ nēme ihe ahu.

5 Ma n’iwu-ayi Moses nyere ayi iwu itu ndinyom di otú a nkume: gini kwa ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya?

6 Ma nka ka ha nēkwu inwa Ya, ka ha we nwe ihe ha gēji bo Ya ebubo. Ma Jisus ruru ala, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n’ala.

7 Ma mb͕e ha nọgidere nāju Ya, O welie Onwe-ya elu, si ha, Onye akēmehieghi n’etiti unu, ya buru uzọ tu ya nkume.

8 O we ruru kwa ala ọzọ, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n’ala.

9 Ma mb͕e ha nuru ya ha pua n’otù n’otù, malite na ndi bu okenye, rue ndi-ikpe-azu: ewe rapu nání Jisus, Ya na nwanyi ahu, ebe o guzoro, n’etiti.

10 Jisus we welie Onwe-ya elu, si ya, Nwanyi, òle ebe ha nọ? ọ̀ dighi onye ọ bula mara gi ikpé?

11 O we si, Ọ dighi onye ọ bula, Onye-nwe-ayi. Jisus we si, Mu onwem amaghi kwa gi ikpé: ga nke gi. site n’ub͕u a adila nēmehie ọzọ.

12 Ya mere Jisus gwara ha okwu ọzọ, si, Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agaghi-ejeghari n’ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu.

13 Ya mere ndi-Farisi siri Ya, Gi onwe-gi nāb͕ara Onwe-gi àmà; àmà nke Gi abughi ezie.

14 Jisus zara, si ha, Asi kwa na Mu onwem b͕ara Onwem àmà, àmà nkem bu ezie; n’ihi na amataram ebe M’siri bia, na ebe M’nāla; ma unu onwe-unu amataghi ebe M’si bia, ma-ọbu ebe M’nāla.

15 Unu onwe-unu nēkpe dika anu-aru si di; Mu onwem ekpeghi onye ọ bula.

16 Ma ọ buru na mu onwem ekpe kwa ikpé, ikpém bu ezie; n’ihi na ọ bughi nání Mu nọ, kama ọ bu Mu onwem na Nna Nke ziterem.

17 Ma edewo kwa n’akwukwọ iwu-unu, na àmà nke madu abua bu ezie.

18 Mu onwem bu onye nāb͕ara Onwem àmà, Nna Nke ziterem nāb͕a-kwa-ram àmà.

19 Ya mere ha si Ya, Òle ebe Nna-Gi di? Jisus zara, si, Unu amataghi m, unu amataghi kwa Nnam: ọ buru na unu mataram, unu gāmata-kwa-ri Nnam.

20 Okwu ndia ka O kwuru n’ebe anēdebe ùtú anātu, mb͕e Ọ nēzí ihe n’ulo uku Chineke: ọ dighi kwa onye ọ bula jidere Ya; n’ihi na oge hour Ya akābiarughi.

21 Ya mere Ọ siri ha ọzọ, Mu onwem nāla, unu gāchọkwam, unu gānwu kwa na nmehie-unu: ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia.

22 Ya mere ndi-Ju nāsi, Ò gēb͕u Onwe-ya, na Ọ nāsi, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia?

23 O we si ha, Unu onwe-unu si n’ebe di ala puta; Mu onwem si n’ebe di elu puta: unu onwe-unu si n’uwa nka puta; Mu onwem esighi n’uwa nka puta.

24 Ya mere M’siri unu, na unu gānwu na nmehie nile unu: n’ihi na ọ buru na unu ekweghi na Mu onwem bu Ya, unu gānwu na nmehie nile unu.

25 Ya mere ha nāsi Ya, Gì onwe-gi bu onye? Jisus siri ha, Ọbuná ihe M’nāgwa kwa unu site na mbu.

26 Enwerem ọtutu ihe M’gēkwu nke M’gēkpe kwa bayere unu: ma Onye ziterem bu ezie; ihe Mu onwem nu-kwa-ra n’ọnu Ya, ihe ndia ka M’nāgwa uwa.

27 Ha amaghi na Ọ nāgwa ha okwu bayere Nna-Ya.

28 Ya mere Jisus siri, Mb͕e ọ bula unu gēweliwori Nwa nke madu elu, mb͕e ahu ka unu gāmara na Mu onwem bu Ya, na ọ dighi kwa ihe M’nēme n’Onwem, kama dika Nnam zírim, otú a ka m’nēkwu ihe ndia.

29 Mu na Onye ziterem nọ kwa; Ọ rapughi nání Mu; n’ihi na Mu onwem nēme ihe nātọ Ya utọ mb͕e nile.

30 Mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, ọtutu madu kwere na Ya.

31 Ya mere Jisus nāsi ndi-Ju ndi kwere-Ya-ri, Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n’okwum, unu bu ndi nēso uzọm n’ezie;

32 unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n’orù.

33 Ha zara Ya, si, Ayi bu nkpuru Abraham, ọ kādighi kwa mb͕e ọ bula ayi bu orù onye ọ bula: Gì onwe-gi si aṅa kwu, Agēme ka unu pua n’orù?

34 Jisus zara ha, si, N’ezie, n’ezie, asim unu, Onye ọ bula nke nēmehie bu orù nmehie.

35 Ma orù adighi-anọgide n’ulo rue mb͕e ebighi-ebi: nwa nānọgide ebighi-ebi.

36 Ya mere ọ buru na Ọkpara gēme ka unu pua n’orù, unu gābu ndi puworo n’orù n’ezie.

37 Amataram na unu bu nkpuru Abraham; ma unu nāchọ uzọ ib͕um, n’ihi na okwum enweghi ọnọdu nime unu.

38 Anamekwu ihe Mu onwem huworo n’ebe Nnam nọ: ya mere unu onwe-unu nēme kwa ihe unu nuru n’ọnu nna-unu.

39 Ha zara, si Ya, Nna-ayi bu Abraham. Jisus si ha, Ọ buru na unu bu umu Abraham, unu gālu ọlu Abraham.

40 Ma ub͕u a unu nāchọ uzọ ib͕um, bú Madu Nke gwaworo unu ezi-okwu, nke M’nuru n’ọnu Chineke: nka ka Abraham nēmeghi.

41 Unu onwe-unu nālu ọlu nna-unu. Ha siri Ya, Amughi ayi onwe-ayi site n’ikwa-iko otù Nna ka ayi nwere, bú Chineke.

42 Jisus siri ha, Ọ buru na Chineke bu Nna-unu, unu gāhum n’anya: n’ihi na Mu onwem siri n’ebe Chineke nọ puta we bia; n’ihi na abiaghm n’Onwem, kama Ya onwe-ya ziterem.

43 N’ìhi gini ka unu nāmaghi ihe M’nēkwu? Ọ bu n’ihi na unu apughi inu okwum.

44 Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n’ezi-okwu, n’ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n’ihe nke aka ya puta: n’ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.

45 Ma n’ihi na Mu onwem nēkwu ezi-okwu, unu ekweghm.

46 Ònye nime unu turum nmehie n’anya? Ọ buru na M’nēkwu ezi-okwu, n’ìhi gini ka unu onwe-unu nēkweghm?

47 Onye sitere na Chineke nānu okwu Chineke: n’ihi nka ka unu onwe-unu nānughi ha, n’ihi na unu esiteghi na Chineke.

48 Ndi-Ju zara, si Ya, Àyi onwe-ayi ekwughi nke-ọma, si na Gi onwe-Gi bu Onye Sameria, I nwe-kwa-ra mọ ọjọ?

49 Jisus zara, si, Mu onwem enweghi mọ ọjọ; kama anamasọpuru Nnam, unu onwe-unu nēmekwam ihe-ihere.

50 Ma Mu onwem achọghi otuto nkem: otù Onye di Nke nāchọ nēkpe kwa ikpé.

51 N’ezie, n’ezie, asim unu, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-ahu ọnwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.

52 Ndi-Ju siri Ya, Ub͕u a ka ayi mara na I nwere mọ ọjọ. Abraham nwuru, na ndi-amuma; ma Gi onwe-gi nāsi, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.

53 Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Abraham uku, onye nwuru anwu? ndi-amuma nwu-kwa-ra: ònye ka I nēme Onwe-gi?

54 Jisus zara, si, Ọ buru na Mu onwem enye Onwem otuto, otuto nkem bu ihe-efu: Nnam bu Onye nēnyem otuto; Onye unu onwe-unu nāsi, na Ọ bu Chineke-unu;

55 unu amaghi kwa Ya; ma Mu onwem matara Ya; ọ buru kwa na agamasi, Amataghm Ya, M’gēyi unu, buru onye-ugha: ma amataram Ya, nēdebe kwa okwu-Ya.

56 Obi tọrọ nna-unu Abraham utọ nke-uku ihu ub͕ọchim; o we hu ya, ṅuri kwa ọṅu.

57 Ya mere ndi-Ju siri Ya, I kāb͕aghi ọgu arọ abua na iri, Ì huwo kwa Abraham?

58 Jisus siri ha, N’ezie, n’ezie, asim unu, Mb͕e akāmughi Abraham Mu onwem di.

59 Ya mere ha tuturu nkume itu Ya: ma Jisus zobere Onwe-ya, we si n’ulo uku Chineke pua.

Categories
JỌN

JỌN 9

1 Mb͕e Ọ nāgabiga, Ọ hu otù nwoke nke kpuru ìsì site n’ọmumu-ya.

2 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Rabai, ònye mehiere, onye a, ma-ọbu ndi muru ya, nke mere ka amua ya n’ìsì?

3 Jisus zara, si, Onye a emehieghi, ndi muru ya emehieghi kwa: kama ka ọlu Chineke we puta ìhè n’aru ya.

4 Ayi aghaghi ilu ọlu Onye ziterem, mb͕e ubọchi fọduru: abali nābia, mb͕e ọ dighi onye ọ bula puru ilu ọlu.

5 Mb͕e ọ bula M’nọ n’uwa, abum Ìhè nke uwa.

6 Mb͕e O kwusiri ihe ndia, Ọ bua ọnu-miri n’ala, were ọnu-miri ahu gwọ ájá, were ájá ahu te n’anya-ya abua,

7 si ya, Je sa miri n’ọdọ-miri ntà nke Sailoam (nke bu, ma asugharia ya, Onye eziteworo). Ya mere O jere, sa miri, bia kwa nāhu uzọ.

8 Ya mere ndi-ab͕ata-obi-ya, na ndi nāhu ya-ri n’oge gara aga, na ọ bu onye-aririọ, ha nāsi, Onye a, ọ̀ bughi onye nānọ ala nāriọ kwa aririọ?

9 Ndi ọzọ nāsi, Ọ bu ya; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama o yiri ya. Ya onwe-ya siri, Mu onwem bu ya.

10 Ya mere ha nāsi ya, Èsi kwa aṅa meghe anya-gi?

11 Onye ahu zara, si, Nwoke ahu anākpọ Jisus gwọrọ ájá, te kwa ya n’anyam abua, sim, Je Sailoam, sa miri: ya mere ejerem, sa miri, ewe me ka M’hu uzọ.

12 Ha si ya, Òle ebe Onye ahu nọ? Ọ si, Amataghm.

13 Ha kutara ndi-Farisi onye ahu nke kpuru ìsì n’oge gara aga.

14 Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n’ubọchi Jisus gwọrọ ájá, we meghe anya-ya.

15 Ya mere ndi-Farisi ju-kwa-ra ya ọzọ otú emere ọ hu uzọ. Ọ si ha, Ọ tukwasiri ájá n’anyam abua, m’we sa miri, nāhu kwa uzọ.

16 Ya mere ufọdu n’etiti ndi-Farisi nāsi, Nwoke a esiteghi n’ebe Chineke nọ, n’ihi na O dighi-edebe ubọchi-izu-ike. Ma ndi ọzọ nāsi, Nwòke bu onye-nmehie si aṅa pu ime ihe-iriba-ama di otú a? Nkewa we di n’etiti ha.

17 Ya mere ha si onye-ìsì ahu ọzọ, Gini ka gi onwe-gi nēkwu bayere Ya, n’ihi na O meghere anya-gi? Ọ si, Ọ bu onye-amuma.

18 Ya mere ndi-Ju ekweghi okwu bayere ya, na o kpururi ìsì, na eme-kwa-ra ya ka ọ hu uzọ, rue mb͕e ha kpọrọ ndi muru onye ahu emere ka ọ hu uzọ,

19 we jua ha, si, Onye a, ọ̀ bu nwa-unu, onye unu nāsi na amuru ya n’ìsì? ò si kwa aṅa hu uzọ ub͕u a?

20 Ndi muru ya zara, si, Ayi matara na onye a bu nwa-ayi, na amu-kwa-ra ya n’ìsì:

21 ma otú ọ nāhu uzọ ub͕u a, ayi amataghi; ma-ọbu onye meghere anya-ya, ayi onwe-ayi amatagh: juana ya; o ruwo dìnkpà; ya onwe-ya gēkwuru onwe-ya.

22 Ihe ndia ka ndi muru ya kwuru, n’ihi na ha nātu egwu ndi-Ju: n’ihi na ndi-Ju kwekọrọri n’etiti onwe-ha ub͕u a, ka esi n’ulo-nzukọ chupu onye ọ bula, ma ọ buru na ọ gēkwuputa na Ọ bu Kraist.

23 N’ihi nka ndi muru ya siri, O ruwo dìnkpà; juana ya.

24 Ya mere ha kpọrọ onye ahu nke ub͕ò abua, bú onye kpururi ìsì, we si ya, Nye Chineke otuto: ayi onwe-ayi matara na Nwoke a bu onye-nmhie.

25 Ya mere onye ahu zara, si, Ma Ọ bu onye-nmehie, amataghm: otù ihe ka m’matara, na, ebe m’kpururi ìsì, ub͕u a anamahu uzọ.

26 ya mere ha siri ya, Gini ka O mere gi? Ò si aṅa meghe anya-gi?

27 Ọ zara ha, si, Agwaram unu ọbuná ub͕u a, ma unu anugh: gini mere unu nāchọ inu ya ọzọ? ùnu onwe-unu nāchọ kwa ighọ ndi nēso uzọ-Ya?

28 Ha we kwutọ ya, si, Gi onwe-gi bu onye nēso uzọ Onye ahu; ma ayi onwe-ayi bu ndi nēso uzọ Moses.

29 Ayi onwe-ayi matara na Chineke agwawo Moses okwu: ma Onye a, ayi amataghi ebe O si puta.

30 Nwoke ahu zara, si ha, Ekwula, n’ihi na ihe-ebube di na nka, na unu onwe-unu amataghi ebe O si puta, ma Ọ meghere anyam.

31 Ayi matara na Chineke adighi-anu olu ndi-nmehie: kama ọ buru na onye ọ bula bu onye nēbi isi ala nye Chineke, nēme kwa ihe Ọ nāchọ, onye ahu ka Ọ nānu.

32 Site na nmalite oge a ọ dighi mb͕e anuru na onye ọ bula meghere anya onye amuru n’ìsì.

33 Ọ buru na Onye a esiteghi n’ebe Chineke nọ, Ọ pughi ime ihe ọ bula.

34 Ha zara, si ya, Amuru gi onwe-gi nime nmehie, ọ̀ bu gi onwe-gi nēzí kwa ayi ihe? Ha we chupu ya n’èzí.

35 Jisus nuru na ha chupuru ya-ri n’èzí; O we chọta ya, si, Gì onwe-gi kwere n’Ọkpara Chineke?

36 Onye ahu zara, si, Ọ̀ bu kwa onye, Onye-nwe-ayi, ka m’we kwere na Ya?

37 Jisus siri ya, I huwo Ya, Onye gi na Ya nēkwu okwu bu kwa Onye ahu.

38 O we si, Onye-nwe-ayi, ekwem. O we kpọ isi ala nye Ya.

39 Jisus we si, Ọ bu ikpé ka Mu onwem ji bia n’uwa nka, ka ndi nāhughi uzọ we hu; ka ndi huru uzọ we ghọ kwa ndi-ìsì.

40 Ndi di n’etiti ndi-Farisi ndi ha na Ya nọ nuru ihe ndia, ha we si Ya, Àyi onwe-ayi kpu-kwa-ra?

41 Jisus siri ha, Ọ buru na unu kpuru ìsì, unu agaghi-enwe nmehie: ma ub͕u a unu nāsi, Ayi nāhu uzọ: nmehie-unu nānọgide.

Categories
JỌN

JỌN 10

1 N’ezie, n’ezie, asim unu, Onye nēsiteghi n’ọnu-uzọ ba n’ogige aturu, kama o si n’ebe ọzọ nārigo ibà, onye ahu bu onye-ori na onye nāpunara madu ihe.

2 Ma onye si n’ọnu-uzọ ba bu onye nāzù aturu.

3 Onye ahu ka onye-ọnu-uzọ nēmeghere uzọ; aturu nānu kwa olu-ya: ọ nākpọ kwa aturu nke aka ya n’aha, n’edupu kwa ha.

4 Mb͕e ọ bula ọ chupuru aturu nke aka ya nile, ọ nāga n’iru ha, aturu ahu nēso kwa ya: n’ihi na ha matara olu-ya.

5 Ma ha agaghi-eso ọbìa ma-ọli, kama ha gāb͕anari ya: n’ihi na ha amataghi olu ndi-ọbìa.

6 Ilu a ka Jisus turu ha: ma ha amaghi ihe ha bu, bú okwu Ọ nāgwa ha.

7 Ya mere Jisus siri ha ọzọ, N’ezie, n’ezie, asim unu, Mu onwem bu ọnu-uzọ nke aturu.

8 Ka ha ra, bú ndi nile burum uzọ bia, ha bu ndi-ori na ndi nāpunara madu ihe: ma aturu ahu anughi olu-ha.

9 Mu onwem bu ọnu-uzọ ahu: ọ buru na onye ọ bula esi na Mu ba, agāzọputa ya, ọ ganābata kwa nāpu kwa, nāhu kwa nri ọ gāta.

10 Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n’iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè.

11 Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma: onye-ọzùzù-aturu ọma nātọb͕ọ ndu-ya n’ihi aturu-ya.

12 Onye-ọlu egoro ego, nke nābughi kwa onye-ọzùzù-aturu, onye aturu nābughi nke aka ya, ọ nāhu agu ka ọ nābia, o we rapu aturu, b͕alaga, agu we nwude ha, chusa kwa ha:

13 n’ihi na ọ bu onye-ọlu egoro ego, ọ kpọghi kwa aturu ahu ihe.

14 Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma; ama-kwa-ram aturu nkem, aturu nkem ma-kwa-ram,

15 dika Nnam maram, dika Mu onwem ma-kwa-ra Nnam; anamatọb͕ọ kwa ndum n’ihi aturum.

16 Aturu ọzọ ka M’nwe-kwa-ra, ndi nēsiteghi n’ogige-aturu nka: aghaghim iduta kwa ndi ahu, ha gānu kwa olum; otù ìgwè-aturu gādi kwa, otù Onye-ọzùzù-aturu.

17 N’ihi nka ka Nnam nāhum n’anya, n’ihi na Mu onwem nātọb͕ọ ndum, ka M’we nara ya ọzọ.

18 Ọ dighi onye ọ bula nānapum ya, kama Mu onwem nātọb͕ọ ya n’Onwem. Enwerem ike itọb͕ọ ya, enwe-kwa-ram ike inara ya ọzọ. Ihe a enyere n’iwu ka M’natara n’aka Nnam.

19 Nkewa putara ọzọ n’etiti ndi-Ju n’ihi okwu ndia.

20 Ọtutu nime ha we si, O nwere mọ ọjọ, anya adighi kwa Ya nma; gini mere unu nānu olu-Ya?

21 Ndi ọzọ nāsi, Ndia abughi okwu onye mọ ọjọ ji. Mọ̀ ọjọ puru imeghe anya ndi kpuru ìsì?

22 Ma ememe icheta owuwu ulo uku Chineke ọhu ruru na Jerusalem: ọ bu mb͕e oyi;

23 Jisus we nējeghari n’ulo uku Chineke n’ìbà Solomon.

24 Ya mere ndi-Ju nọgidere Ya buruburu, we si Ya, Ì nākwuba nkpuru-obi-ayi n’elu rue ole mb͕e? Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, gwawa ayi.

25 Jisus zara ha, si, Agwaram unu, ma unu adighi-ekwe: ọlu nke Mu onwem nālu n’aha Nnam, ndia nāb͕aram àmà.

26 Ma unu onwe-unu adighi-ekwe, n’ihi na unu adighi nime aturu nkem.

27 Aturu nkem nānu olum, Mu onwem ma-kwa-ra ha, ha nēsokwam:

28 Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n’iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n’akam.

29 Nnam, Nke nyeworom ha, bu Onye uku kachasi ihe nile; ọ dighi kwa onye ọ bula puru inapu ihe n’aka Nnam.

30 Mu onwem na Nnam bu otù.

31 Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya.

32 Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M’gosiri unu site na Nnam; n’ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume?

33 Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n’ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n’ihi nkwulu; n’ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke.

34 Jisus zara ha, si, Èdeghi ya n’iwu-unu, si, Mu onwem siri, Chi ka unu bu?

35 Ọ buru na Ọ kpọrọ ndi ahu chi, ndi okwu Chineke biaruru (apughi kwa imebi ihe edere n’akwukwọ nso),

36 ùnu onwe-unu nēkwu okwu bayere Onye ahu Nnam doro nsọ zite kwa n’uwa, si, I nēkwulu Chineke; n’ihi na asim, Abum Ọkpara Chineke?

37 Ọ buru na alughm ọlu Nnam, unu ekwelam.

38 Ma ọ buru na aluam ha, ọbuná ma asi na unu ekweghi Mu onwem, nēkwerenu ọlum: ka unu we mara nāmagide kwa na Nnam di nimem, na Mu onwem di kwa nime Nnam.

39 Ha we chọ kwa uzọ ijide Ya: O we pua n’aka-ha.

40 O we je ọzọ gabiga n’ofè Jọdan rue ebe Jọn nēme baptism na mbu; O we n-ogide n’ebe ahu.

41 Ọtutu madu we biakute Ya; ha nāsi kwa, N’ezie ọ dighi ihe-iriba-ama Jọn mere: ma ka ha ra, bú ihe Jọn kwuru bayere Onye a, bu ezi-okwu

42 Ọtutu madu we kwere na Ya n’ebe ahu.