Categories
JOEL

JOEL 1

1 Okwu Jehova nke ruru Joel, nwa Petuel, nti.

2 Nurunu nka, unu ndi-okenye, ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile bi n’ala nka. Nka, ọ̀ diwo n’ubọchi-unu? mà-ọbu n’ubọchi nna-unu-hà?

3 Kọrọnu ya umu-unu, ka umu-unu kọ-kwa-ra umu-ha, ka umu-ha kọ-kwa-ra ọb͕ọ ọzọ.

4 Ihe palmer-worm rifọworo ka igurube riworo; ihe igurube rifọworo ka ukpala riworo; ihe ukpala rifọworo ka ọbubu riworo.

5 Tetanu, unu ndi nāṅubiga manya ókè, kwanu ákwá; kwasi-kwa-nu ákwá ike, unu nile ndi nāṅu manya-vine, n’ihi manya utọ; n’ihi na ebipuwo ya n’ọnu-unu.

6 N’ihi na otù mba arigokwasiwo n’alam, o nwere ume, nādighi kwa ọnu-ọgugu; ezé-ya nile di ka ezé ọdum, o nwe-kwa-ra ikiri-ezé nke nne-ọdum.

7 O mewo ka osisi vine nkem ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, o mewo ka osisi fig nkem ghọ irighiri-osisi: o kpechapusiwo nb͕ub͕ọ-ya, kpofue ya; emewo ka alaka-ya nile di ọcha.

8 Kwa ákwá dika nwa-ab͕ọghọ nke ekeworo ákwà-nkpe n’ihi di o nwere na nwata.

9 Ebipuwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n’ulo Jehova; ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, eruwo újú.

10 Emebiwo ubi, ala eruwo újú; n’ihi na emebiwo ọka, ihere emewo manya-vine ọhu, manu ọhu atalatawo.

11 Ka ihere me unu, ndi-ubi, kwasienu ákwá ike, unu ndi-ubi-vine, bayere ọka wheat, baye-kwa-ra ọka barley; n’ihi na owuwe-ihe-ubi alawo n’iyì.

12 Ihere emewo osisi vine, osisi fig atalatawo; osisi pomegranate, nkwu kwa, na osisi apple, osisi nile nke ọhia akpọnwuwo akpọnwu: n’ihi na ihere emewo obi-utọ, ọ pua n’aru umu madu.

13 Kenu ákwà-nkpe n’úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n’obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n’ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n’ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n’ulo Chineke-unu.

14 Donu obubu-ọnu nsọ, Kpọnu ubọchi nb͕ochi, chikọtanu ndi-okenye na ndi nile bi n’ala n’ulo Jehova, bú Chineke-unu, tiku-kwa-nu Jehova.

15 Ewó, ubọchi ahu! n’ihi na ubọchi Jehova di nso, dika nbibi nke sitere n’aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.

16 Ọ̀ bughi na ncherita-iru anya-ayi ka ebipuworo ihe-oriri, e, ọṅù na otite-egwú-ọṅù n’ulo Chineke-ayi?

17 Nkpuru-ọghigha akpọnwuwo n’okpuru ọkpurukpu-ájá-ha; emewo ka ulo nile anēdebe ihe-oriri tọb͕ọrọ n’efu, akwatuwo ọba nile; n’ihi na ihere emewo ọka.

18 Le otú anu-ulo ezewo ume nke-uku! ọ nāb͕a ìgwè ehi nile ghari, n’ihi na ọ dighi nri-ọtita ha nwere; e, ìgwè ewu na aturu nile ahuwo ahuhu ikpe-ọmuma.

19 Ọ bu Gi, Jehova, ka m’nākpọku: n’ihi na ọku erichapuwo ebe-ita-nri nile nke ọzara, ire-ọku esuyewo kwa ọku n’osisi nile nke ọhia.

20 Ọzọ, agu Gi nāgu anu ọhia nile: n’ihi na ebe nile miri si erù atasiwo, ọku eripiawo kwa ebe-ita-nri nile nke ọzara.

Categories
JOEL

JOEL 2

1 Fùanu opì-ike nime Zaion, ti-kwa-nu nkpu agha n’ugwu nsọm; ka ndi nile ndi bi n’ala nka ma jijiji: n’ihi na ubọchi Jehova nābia, n’ihi na ọ di nso;

2 ọ bu ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri, dika chi-ọbubọ nke bọsaworo n’elu ugwu nile; otù ndi nābia di ọtutu nwe kwa ume, ihe di ka ha adighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, mb͕e ha gasiri ihe di ka ha agaghi-adi ọzọ, rue arọ nile nke ọb͕ọ na ọb͕ọ.

3 N’iru ha ka ọku nēripia ihe; ọ bu kwa n’azu ha ka ire-ọku nēsuye ọku esuye: dika ubi ahu ab͕ara ogige, bú Iden, ka ala di n’iru ha, n’azu ha ọ bu ọzara tọb͕ọrọ n’efu; e, ọ dighi kwa ihe ọ bula b͕apuworo n’aka-ha.

4 Dika inyinya si di n’ile ha anya, otú a ka ha di n’ile ha anya; e, dika ndi-inyinya, otú a ka ha nāb͕a ọsọ.

5 Dika olu ọtutu ub͕ọ-ala n’elu ugwu ka ha nāmali amali, dika olu ire-ọku nke nēripia ahihia-ọka, dika otù ndi nke nwere ume nke edoworo n’usoro agha.

6 N’iru ha ndi nile di iche iche nāb͕ali: iru nile achagharisiwo.

7 Dika ndi-dike ka ha nāb͕a ọsọ; dika ndi-agha ka ha nārigo mb͕idi; onye ọ bula n’uzọ-ya nile, otú a ka ha nāga ije, ha adighi-agwab͕u kwa agwab͕u n’ojije nile ha.

8 Ha adighi-enurita onwe-ha; onye ọ bula n’uzọ-ya atuliri atuli, otú a ka ha nāga ije: ọ bu kwa n’etiti ihe-agha ka ha nāda nējebìghi ije-ha.

9 N’obodo ka ha nāb͕aghari; n’elu mb͕idi ka ha nāb͕a ọsọ; n’ulo ka ha nārigobata; ha si na window nile abà nime dika onye-ori.

10 N’iru ha ka ala maworo jijiji; elu-igwe emewo nkpatu: anyanwu na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achikọpuwo kwa onwunwu-ha:

11 Jehova emewo kwa ka olu-Ya da n’iru usu-ndi-agha-Ya; n’ihi na ihe bara uba nke-uku ka ọmuma-ulo-ikwū-Ya bu; n’ihi na onye nwere ume ka onye nēme ihe O kwuru bu: n’ihi na ubọchi Jehova di uku di kwa egwu nke-uku; ònye kwa gānagide ya?

12 Ma ọbuná ub͕u a, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), werenu obi-unu nile, werekwa obubu-ọnu, were kwa ikwa-ákwá, were kwa iti-aka-n’obi, chigharikutem:

13 dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe-unu, chigharikute Jehova, bú Chineke-unu: n’ihi na Onye-amara na Onye-obi ebere ka Ọ bu, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n’ebere, Ọ nēcheghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu Ọ gēweta.

14 Ònye mara? eleghi anya O gēchighari, chègharia uche, me ka ngọzi fọdu n’azu Ya; bú onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu inye Jehova, bú Chineke-unu.

15 Fùanu opì-ike nime Zaion, donu obubu-ọnu nsọ, kpọsanu ubọchi nb͕ochi:

16 menu ka ndi Israel zukọta, donu nkpọkọta Israel nsọ, chikọtanu ndi-okenye, menu ka umu-ntakiri na ndi nāṅu ara zukọta: ka onye nālu nwunye ọhu si n’ime-ulo-ya puta, ka nwunye ọhu si kwa n’ulo-ndina-ya puta.

17 Ka ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, kwa ákwá n’etiti uzọ-nbata-Ya na ebe-ichu-àjà-Ya, si, Jehova, mere ndi-Gi ebere, arara-kwa-la ihe-nketa-Gi nye n’ita-uta, Ka mba nile ọzọ we ghara ichi ha: n’ìhi gini ka ha gāsi n’etiti ndi nile dí iche iche, Òle ebe Chineke-ha nọ?

18 Jehova we kwo ekworo ala-Ya, nwe ọmiko n’aru ndi-Ya.

19 Jehova we za, si ndi-Ya, Le, M’ganēzitere unu ọka-unu na manya-vine ọhu unu na manu ọhu unu, afọ ya ewe ju unu: M’gaghi-eme kwa unu ihe-ita-uta ọzọ n’etiti mba nile:

20 ma M’gēme ka usu-ndi-agha Ugwu ahu si n’aru-unu je n’ebe di anya, M’gāchubà kwa ya n’ala kpọrọ nku na ebe tọb͕ọrọ n’efu, iru-ya n’oké osimiri Iru-anyanwu, na nsọtu-Ya n’oké osimiri Ọdida-anyanwu; ísì ọjọ ya gārigo kwa, e, ísì-ya nke jọb͕uru onwe-ya gārigo, n’ihi na o mewo onwe-Ya uku n’ime ihe.

21 Atula egwu, gi ala, te egwú ọṅù, ṅuri kwa; n’ihi na Jehova emewo Onwe-ya uku n’ime ihe.

22 Unu atula egwu, unu anu ọhia; n’ihi na ebe-ita-nri nile nke ọzara nēpuputa ahihia ndu, n’ihi na osisi nāmi nkpuru-ya, osisi fig na osisi vine nāmi nkpuru ka ike-ha ra.

23 Umu Zaion, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, ṅuri kwa na Jehova, bú Chineke-unu: n’ihi na Ọ nēnye unu miri-ozuzo mbu ka ezi omume-Ya si di, me kwa ka oké miri-ozuzo zodatara unu, bú miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, n’ọnwa mbu.

24 Ebe-nzọcha-ọka nile gējuputa kwa n’ọka wheat, ebe-inara-manya-vine na manu gērubiga kwa na manya-vine ọhu na manu ọhu.

25 M’gākwughachi kwa unu arọ nile nke igurube na ukpala na ọbubu na palmer-worm riworo, bú oké usu-ndi-agham nke M’zitere n’etiti unu.

26 Unu gēriju afọ, afọ ewe ju unu, unu ewe to aha Jehova, bú Chineke-unu, Onye mesoworo unu n’ilu oké ọlu: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e ebighi-ebi.

27 Unu gāma kwa na n’etiti Israel ka M’nọ, na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, na ọ dighi onye ọzọ: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e abighi-ebi.

28 O gēru kwa ma emesia, na M’gāwusa Mọm n’aru anu-aru nile, bú madu; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, ndi-okenye-unu gārọ nrọ, umu-okorọbia-unu gāhu ọhù:

29 e, ọbuná n’aru ndi-orù ndikom na n’aru ndinyom nēje ozi ka M’gāwusa Mọm na mb͕e ahu.

30 M’gēnye kwa ihe-ebube di iche iche n’elu-igwe na n’uwa: ọbara, na ọku, na ogidi nke anwuru-ọku.

31 Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri, ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara, tutu ubọchi Jehova abia, bú ubọchi ahu di uku di kwa egwu.

32 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Jehova, agēme ka o wepuga onwe-ya: n’ihi na n’ugwu Zaion na nime Jerusalem ka ufọdu ndi b͕apuru ab͕apu gādi, dika Jehova siworo, na n’etiti ndi fọduru afọdu ka ndi Jehova nākpọ gādi.

Categories
JOEL

JOEL 3

1 N’ihi na, le, na mb͕e ahu na n’oge ahu, mb͕e M’gēme ka ndi Juda na Jerusalem adọtara n’agha lata,

2 M’gāchikọta mba nile, me ka ha rida na ndagwurugwu Jehoshafat; Mu na ha gēkpe kwa ikpe n’ebe ahu bayere ndim na ihe-nketam, bú Israel, ndi ha chusaworo n’etiti mba nile, ọ bu kwa alam ka ha kère.

3 Ọ bu kwa ndim ka ha fetaworo na nzà: ha we nye nwa-okoro iji b͕anwe nwanyi nākwa iko, nwa-mb͕ọ ka ha re-kwa-ra n’ihi manya-vine, ka ha we ṅua.

4 Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M’mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M’gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n’isi-unu.

5 Ebe ọ bu ọla-ọcham na ọla-edom ka unu wereworo, ebe ọ bu kwa ezi ihem nile anāchọsi ike ka unu chibàworo n’ulo uku nile unu;

6 ebe ọ bu kwa umu Juda na umu Jerusalem ka unu nēre nye umu ndi Jevan, ka unu we me ka ha si n’ókè-ala-ha je n’ebe di anya:

7 le, M’gaje isi n’ebe ahu ebe unu nērega ha-ri kpọte ha, nyeghachi nmesò-unu n’isi-unu;

8 M’gēre kwa umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom nye n’aka umu Juda, ha ewe re ha nye ndi Sheba, bú mba di anya: n’ihi na Jehova ekwuwo.

9 Kpọsanu nka n’etiti mba nile; donu agha nsọ: kpọtenu ndi-dike; ka ndi-agha nile biarue nso, rigota.

10 Kpugharianu mma-ọgè-unu ka ha buru mma-agha, na mma-ikwa-osisi-unu ka ha buru ube: ka onye-ume-ngwu si, Dike ka m’bu.

11 Menu ngwa, bia, unu mba nile ndi bi buruburu, chikọtanu onwe-unu: Jehova, me ka ndi-dike-Gi rida n’ebe ahu.

12 Ka mba nile teta, rigota na ndagwurugwu Jehoshafat: n’ihi na n’ebe ahu ka M’gānọdu ikpe mba nile bi buruburu ikpe.

13 Tiye mma-iwe-ihe-ubi, n’ihi na ihe agēwe n’ubi achawo: bianu, zọcha; n’ihi na ebe-nzọcha-nkpuru-vine ejuwo, ebe-inara-manya-vine nile erubigawo; n’ihi na ihe ọjọ ha bara uba.

14 Ọtutu ìgwè madu, ọtutu ìgwè madu nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe! n’ihi na ubọchi Jehova di nso nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe.

15 Anyanwu na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achikọpuwo kwa onwunwu-ha.

16 Jehova gēsi kwa na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; elu-igwe na uwa gēme kwa nkpatu: ma Jehova gāburu ndi-Ya ebe-nb͕abà, Ọ gābu-kwa-ra umu Israel ebe siri ike.

17 Unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Onye bi na Zaion, bú ugwu nsọm: Jerusalem ewe di nsọ, ndi ala ọzọ agaghi-agabiga kwa nime ya ọzọ.

18 Ọ gēru kwa n’ubochi ahu, na ugwu nile ganābusa manya-vine utọ, miri-ara ganērù kwa n’ugwu ntà nile, miri ganērù kwa n’ebe nile nke Juda miri si erù; isi-iyi gēsi kwa n’ulo Jehova puta, de ndagwurugwu Shitim.

19 Ijipt gāghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, Edom gāghọ kwa ọzara, bú ebe tọb͕ọrọ n’efu, n’ihi ihe-ike emere umu Juda, n’ihi na ha awusiwo ọbara nēmeghi ihe ọjọ n’ala-ha.

20 Ma Juda gābu ebe madu bi rue mb͕e ebighi-ebi, Jerusalem kwa rue ọb͕ọ na ọb͕ọ.

21 M’gāgu kwa ọbara-ha n’ihe ikpe nāmaghi, bú nke M’nāgughi ya n’ihe ikpe nāmagh: n’ihi na Jehova nēbi nime Zaion.