Categories
JOB

JOB 41

1 Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi?

Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya?

2 Ì gētiye udọ̀-ami n’imi-ya?

Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya?

3 Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara?

Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò?

4 Ò gēso gi b͕a ndu?

Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi?

5 Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu?

Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi?

6 Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia?

Hà gēkè ya n’etiti ndi-ahia?

7 Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya?

Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya?

8 Tukwasi ya ọbu-aka-gi;

Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ.

9 Le, nchere-ya bu ihe-ugha:

Àdighi-atuda madu ọbuná n’ile ya anya?

10 Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya:

Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n’irum?

11 Ònye buru uzọ nyem, nke M’gākwughachi?

Ihe ọ bula nke di n’okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.

12 M’gaghi-ab͕a nkiti bayere ihe nile di ya n’aru,

Ma-ọbu okwu nke idi-ike-ya, ma-ọbu ima-nma nke odudo-n’usoro-ya.

13 Ònye kpugheworo iru uwe-ya?

Ònye gābà n’ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua?

14 Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya?

Ezé-ya di oké ujọ buruburu.

15 Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya,

Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.

16 Dika otù si nọ ibe-ya nso,

Ifufe adighi-abà n’etiti ha.

17 Anēme ka otù rapara n’aru nwa-nne-ya;

Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha.

18 Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu,

Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.

19 N’ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa,

Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha.

20 N’oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa,

Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.

21 Iku-ume-ya nāmunye icheku,

Ire-ọku nēsi kwa n’ọnu-ya puta.

22 N’olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya,

Ọ bu kwa n’iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.

23 Ibewa urù anu-aru-ya rapara n’aru onwe-ha:

O siri ike n’aru ya; agaghi-emeghari ya.

24 Obi-ya siri ike dika nkume;

O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri.

25 Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ:

Site n’imebi-obi ha nēsihie uzọ.

26 Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike;

Ya na ube, na àkú, na uwe-agha.

27 Ọ nāgu ígwè n’okporo-ọka,

Nāgu kwa ọla n’osisi rere ure.

28 Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga:

Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka.

29 Anāgu ndele n’ahihia-ọka:

Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì.

30 Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ:

Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n’elu apiti.

31 Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite:

Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ.

32 Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya;

Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ.

33 Ọ dighi nke di ka ya n’elu ájá uwa,

Nke emeworo nēnweghi ujọ.

34 Ihe nile nke di elu ka ọ nāhu:

Ya onwe-ya bu eze anu-ọhia nile di nganga.

Categories
JOB

JOB 42

1 Job we za Jehova, si,

2 Amawom na I puru ime ihe nile,

Amawokwam na adighi-eb͕ochi nzube ọ bula nke sitere na Gi.

3 Ònye bu onye a nke nēzobe ndum-ọdu n’enweghi ọmuma-ihe?

N’ihi ya ka m’gosiworo ihe nke m’nādighi-aghọta,

Ihe dikaririm ebube, nke m’nādighi-amata.

4 Biko, nuru, mu onwem gēkwu kwa;

M’gāju Gi, Gi me kwa ka m’mara.

5 Site n’ọnunu nti ka m’nuru Gi;

Ma ub͕u a anyam ahuwo Gi.

6 N’ihi nka ka m’nāju onwem aju, we chègharia

N’elu ájá na ntu.

7 O rue, mb͕e Jehova gwasiri Job okwu ndia, na Jehova siri Elifaz, bú onye Timan, Iwem di ọku megide gi, megide kwa ndi-eyì-gi abua: n’ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuworo.

8 Ma ub͕u a, chirinu n’onwe-unu oke-ehi asa na ebulu asa, jekuru orùm, bú Job, surere onwe-unu àjà-nsure-ọku; Job, bú orùm, gēkpe kwa ekpere bayere unu; n’ihi na n’ezie ọ bu ya ka M’gāhu iru-ọma, ka M’ghara imeso unu dika nzuzu-unu si di; n’ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuru.

9 Elifaz, bú onye Timan, na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama, we je, me dika Jehova gwara ha: Jehova we hu Job iru-ọma.

10 Jehova me-kwa-ra ka ndọta-n’agha Job lata, mb͕e o kpere ekpere bayere ndi-eyì-ya: Jehova we tukwasi n’ihe nile Job nwere okpùkpù abua.

11 Umu-nne-ya ndikom nile, na umu-nne-ya ndinyom nile, na ndi nile mara ya na mb͕e gara aga, we biakute ya, so ya rie nri n’ulo-ya: ha we gosi ya ebere ha ji n’aru ya, kasi kwa ya obi bayere ihe ọjọ ahu nile nke Jehova mere ka ọ biakwasi ya: ha we nye ya, nwoke ọ bula otù iberibe ego, na nwoke ọ bula otù nb͕a-aka ọla-edo.

12 Ọzọ, Jehova gọziri ikpe-zu Job kari nmalite-ya, o we nwe orú nnù ewu na aturu na nnù iri-na-ise, na nnù camel iri-na-ise, na nnù ehi ise ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu abua na ọgu iri.

13 O nwe-kwa-ra umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ.

14 O we kpọ aha nwayi mbu, Jemaima; na aha nwayi nke-abua, Kezaia; na aha nwayi nke-atọ, Keren-hapuk.

15 Ma ahughi ndinyom, mara nma dika umu-ndinyom Job n’ala ahu nile: nna-ha we nye ha ihe-nketa n’etiti umu-nne-ha ndikom.

16 Job we di ndu mb͕e ihe a gasiri ọgu arọ asa, o we hu umu-ya, na umu umu-ya, bú ọb͕ọ anọ.

17 Job we nwua, buru agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ.