Categories
JOB

JOB 11

1 Zofa, bú onye Neama, we za, si,

2 Àgaghi-aza ọtutu okwu?

Àgāgu kwa onye eb͕ub͕ere-ọnu n’onye ezi omume?

3 Ekwukwu-Gi nile nēme ka madu b͕a nkiti;

I we chìa ọchì, ma ọ dighi onye nēme ka ihere me gi.

4 I we si, Nmutam di ọcha,

M’di kwa ọcha n’anya-Gi.

5 Ma otú ọ di, ọ gādim nọ̄ nma ma asi na Chineke ekwue okwu,

Saghe eb͕ub͕ere-ọnu-Ya megide gi;

6 Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe,

Na ọ di okpukpu n’izube ihe.

Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi.

7 Ì gēsi n’ogwugwu chọputa Chineke?

Ì gāchọputa Onye Nke puru ime ihe nile rue ebe Ọ sọturu?

8 Ọ ra ka ebe di elu nile nke elu-igwe; gini ka i gēme?

Ọ di omimi kari ala-mọ; gini ka i gāmara?

9 Ọtùtù-ya di ogologo kari uwa,

Di kwa obosara kari oké osimiri.

10 Ọ buru na Ọ ga n’iru, mechibido madu uzọ,

Kpọkọta nkpọkọta, ònye gēme kwa ka Ọ laghachi?

11 N’ihi na Ya onwe-ya mara madu efu:

Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya.

12 Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi,

Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.

13 Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi,

We b͕asa ọbu-aka-gi abua n’ebe Ọ nọ;

14 Ọ buru na ajọ ihe adi n’aka-gi, me ka ọ di n’ebe di anya,

Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile;

15 N’ihi na mb͕e ahu i gēweli iru-gi nēnweghi ọlu n’aru-gi;

I gābu kwa ihe siri ike dika ọla awuru awu, i gaghi-atu kwa egwu:

16 N’ihi na gi onwe-gi gēchezọ ọnọdu ọjọ gi,

Dika miri nke gabigara agabiga ka i gēcheta ya:

17 Kari etiti-ehihie ka ubọchi ndu-gi gēbili kwa;

Ọ buru na oké ọchichiri adi, ọ gādi ka ututu.

18 I gātukwasi kwa obi, n’ihi na olile-anya di;

I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina.

19 Ọzọ kwa, i gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka i ma jijiji;

Ọtutu madu gēme kwa ka iru-gi dajua.

20 Ma anya ndi nēmebi iwu gādala n’isi,

Ebe-nb͕alaga alanariowo kwa ha n’iyì,

Nkubì-ume bu kwa olile-anya-ha.

Categories
JOB

JOB 12

1 Job we za, si,

2 N’ezie unu onwe-unu bu ndi bu ihe,

Unu na amam-ihe gānwukọ n’otù.

3 Enwe-kwa-ram obi dika unu;

Mu onwem abughi onye dara ada kari unu:

Ma ònye ka ọ bu nke ihe dika ndia nādighi n’aka?

4 Onye bu ihe-ọchì nke madu-ibe-ya ka m’bu,

Bú onye nākpọku Chineke, O we za ya:

Ihe-ọchì ka onye ezi omume nke zuru okè bu.

5 Nleda diri ọdida n’èchìchè onye nọ jū;

Edoziwo ya nye ndi ukwu-ha nāb͕uchapu ab͕uchapu.

6 Ulo-ikwū nile nke ndi nāpunara madu ihe di n’udo,

Ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi nākpasu Chineke iwe;

Bú onye ọ bula nke wetaworo chi-ya n’aka-ya.

7 Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe,

Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi:

8 Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe;

Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi.

9 Ọ̀ bu onye nāmaghi n’ihe ndia nile,

Na aka Jehova emewo nka?

10 Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n’aka-Ya,

Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.

11 Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu?

Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya?

12 Nime ndi kara nká ka amam-ihe di,

N’ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.

13 N’aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di;

Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.

14 Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ;

Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.

15 Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ;

Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.

16 N’aka-Ya ka ike na nzube-ihe di;

O nwere onye nēmehie n’amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n’amaghi-ama.

17 Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n’agha,

Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.

18 Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo,

We ke ihe-ọkiké n’úkwù-ha.

19 Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha,

Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.

20 Ọ nēwezuga okwu eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi,

Ezi uche nke ndi-okenye ka Ọ nēwepu kwa.

21 Ọ nāwusa nleda n’aru ndi amara aha-ha,

Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra.

22 Ọ nēsi n’ọchichiri kpughepu ihe di omimi,

We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè.

23 Ọ nēme ka mba di uku, Ọ nēme kwa ka ha la n’iyì:

Ọ nāb͕asa mba, nēdu kwa ha.

24 Ọ nēwezuga obi ndi-isi nke ndi uwa,

We me ka ha waghari n’ebe tọb͕ọrọ n’efu ebe uzọ nādighi.

25 Ha nāsọghari ìsì n’ọchichiri nēnweghi ìhè,

O we me ka ha kpafue dika onye ṅubigaworo manya ókè.

Categories
JOB

JOB 13

1 Le, ihe a nile ka anyam huworo,

Ntim anuwo, ghọta kwa ya.

2 Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m’maworo, ọbuná mu onwem:

Mu onwem abughi onye dara ada kari unu.

3 Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m’gāgwa okwu,

Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.

4 Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu,

Ndi-dibia efu ka unu nile bu.

5 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti!

Ọ we ghọro unu amam-ihe.

6 Biko, nurunu iru-ukam,

Ṅa-kwa-nu nti n’ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.

7 Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume?

Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?

8 Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma?

Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?

9 Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu?

Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?

10 Ọ ghaghi ibara unu nba,

Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo.

11 Nbùli-elu-Ya adighi-eme ka unu tua egwu nke-uku?

Oké egwu-Ya adighi-adakwasi kwa unu?

12 Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu,

Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu.

13 B͕anu nkiti, pua n’ebe m’nọ, ka m’kwu kwa, mu onwem,

Gini gāgabiga kwa n’arum?

14 N’ìhi gini ka m’gēburu anu-arum n’ezém,

Tiye kwa ndum n’ọbu-akam?

15 Le, Ọ gēb͕um; m’gaghi-echere:

Otú ọ di, uzọm nile ka m’gāru uka n’iru Ya.

16 Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa;

N’ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n’iru Ya.

17 Nurunu okwum nile nke-ọma,

Ka nkwuputam di kwa na nti-unu.

18 Biko, le, edowom ikpém n’usoro;

Amawom na mu onwem bu onye ezi omume.

19 Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe?

N’ihi na ub͕u a ka m’gāb͕a nkiti, kubìe ume.

20 Nání emelam ihe abua,

Mb͕e ahu m’gaghi-ezopu onwem n’iru Gi:

21 Me ka ọbu-aka-Gi dipu n’arum n’ebe di anya;

Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m’tua egwu nke-uku.

22 Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa;

Ma-ọbu ka m’kwue, I we zam.

23 Àjọ omume na nmehie m’nwere di ole?

Me ka m’mara njehiem na nmehiem.

24 N’ìhi gini ka I nēzo iru-Gi,

Nēchè kwa na mu bu onye-iro n’ebe I nọ?

25 Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji?

Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ?

26 N’ihi na I nēde ihe di ilu n’akwukwọ megidem,

I nēme kwa ka m’nweta ajọ omume nile m’mere n’okorọbiam:

27 I nētiye kwa ukwum abua n’ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya;

I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum:

28 Bú madu nke di ka ihe rere ure nke nāka nká,

Dika uwe nke nla riworo.

Categories
JOB

JOB 14

1 Madu nke nwayi muru,

Ubọchi-ndu-ya di nkpunkpu, afọ ejuwo kwa ya n’ahuhu.

2 Dika okoko-osisi ka ọ putaworo, ewe nēbipu ya:

O we nāb͕alaga dika onyinyo, ọ dighi-eguzo kwa.

3 Ọ̀ bu kwa n’aru onye a ka I megheworo anya-Gi,

Me ka m’so Gi ba n’ikpé?

4 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ihe ọcha gāputa n’ihe ruru árú! ọ dighi otù ihe ọcha gāputa na ya.

5 Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n’aka-Gi,

I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya;

6 Lepu ya anya, ka o we kwusi,

Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu.

7 N’ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya,

Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.

8 Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n’ala,

Ogwe-ya anwu kwa n’ájá;

9 Site n’ísì miri ọ gāma akwukwọ,

Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.

10 Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya:

Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?

11 Miri esiwo n’oké osimiri la,

Osimiri we tasia, takọrọ;

12 Otú a madu edinawo, ọ dighi-ebili kwa:

Rue mb͕e elu-igwe nādighi, ha agaghi-eteta,

Agaghi-akpọte kwa ha n’ura-ha.

13 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n’ala-mọ,

Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri,

Ma asi na I kparam ókè, we chetam!

14 Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ?

Ubọchi nile nke obubu-agham ka m’gēche,

Rue mb͕e nb͕anwem gābia.

15 I gākpọ òkù, mu onwem gāza kwa Gi:

Agu ọlu aka-Gi gāgu Gi.

16 N’ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu:

Ì dighi-elezi nmehiem anya?

17 Akachiwo njehiem akàrà n’àkpà,

I we tekpue ajọ omumem ihe.

18 Ma otú ọ di, ugwu nke nāda ada nāla n’iyì,

Anākwapu kwa oké nkume n’ọnọdu ya.

19 Miri nēme ka nkume ta;

Orúrú-ya nāṅachapu ájá ala:

Olile-anya madu ka I mewo-kwa-ra ka ọ la n’iyì.

20 I nwere ike n’aru ya rue mb͕e ebighi-ebi, ọ we la;

I nēme ka iru-ya b͕anwe, I we zilaga ya.

21 Anāsọpuru umu-ya ndikom, ma ọ dighi-ama ya;

Ha nāghọ kwa ndi ntà, ma ọ dighi-amata ihe bayere ha.

22 Nání na o nēb͕u anu-aru-ya nke dikwasi ya nb͕u,

Nkpuru-obi-ya nke di nime aru-ya nēru kwa újú.

Categories
JOB

JOB 15

1 Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

2 Onye mara ihe, ọ̀ gēwere ọmuma-ihe nke bu nání ifufe za?

Ọ̀ gēmeju kwa afọ-ya n’ifufe Iru-anyanwu?

3 Ọ̀ gēwere okwu nābaghi n’ihe ru uka,

Ma-ọbu okwu nke ọ nējighi ha bara madu urù?

4 E, gi onwe-gi nēmebi egwu,

Nēbilata kwa ntughari-uche n’iru Chineke.

5 N’ihi na ajọ omume-gi nēzi ọnu-gi ihe,

I nārọputa kwa ire ndi-aghughọ.

6 Ọnu-gi nāma gi ikpe, ọ bughi mu onwem;

Eb͕ub͕ere-ọnu-gi nāza kwa imegide gi.

7 Ì bu madu mbu amuru?

Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi?

8 Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti?

Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe?

9 Gini ka i mara nke ayi nāmaghi?

Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi?

10 Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n’etiti ayi,

Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.

11 Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà,

Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ?

12 Gini mere obi-gi ji ebupu gi?

Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?

13 Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke,

We me ka okwu nile di otú a si n’ọnu-gi puta.

14 Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n’obi,

Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?

15 Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;

Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n’anya-Ya.

16 Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n’anya-Ya,

Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?

17 M’gēkwuputara gi, gem nti;

Ma nka ka m’huworo, m’gākọ kwa ya:

18 (Nke ndi mara ihe nēgosi

Site na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;

19 Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala,

Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n’etiti ha:)

20 Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali,

Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji.

21 Olu oké egwu di na nti-ya abua;

Mb͕e ọ nọ n’udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:

22 Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n’ochichiri lata,

Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu:

23 Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di?

Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n’aka-ya:

24 Ahuhu na nkpà nēme ka ọ tua egwu nke-uku;

Ha nwere ike n’aru ya, dika eze nke nọ na njikere ibu agha:

25 N’ihi na o setipuwo aka-ya imegide Chineke,

Ọ bu kwa imegide Onye Nke puru ime ihe nile ka ọ nēme onwe-ya onye di ike;

26 Ọ nēwere olu kwesiri ike b͕akwasi Ya,

Were kwa ihe-nb͕ochi di ib͕idi nke ọta-ya:

27 Nihi na o werewo abuba-ya kpuchie iru-ya,

Me ka abuba nke di arọ́ di n’úkwù-ya;

28 O we biri n’obodo ezopuru n’uwa,

Nime ulo nke madu nādighi-ebi nime ha,

Nke ejikereworo ighọ obo-ihe.

29 Ọ gāghi-abu ọgaranya, àkù-ya adighi-eguzosi kwa ike,

Ọ dighi-eseti kwa ihe ha nwere n’uwa.

30 Ọ gaghi-esi n’ọchichiri wezuga onwe-ya;

Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku,

Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n’iku-ume nke ọnu-Ya.

31 Ka ọ ghara ikwere n’ihe-efu, eduhiewo ya:

N’ihi na ihe-efu gābu ihe-nb͕anwe-ya.

32 Tutu ubọchi-ya erue ka agēmezu ya,

Alaka-ya agaghi-adi ka ahihia ndu.

33 Ọ gēnwosisi nkpuru-vine-ya nke nāchaghi acha, dika osisi vine,

Ọ gātuda kwa okoko-osisi-ya, dika osisi olive.

34 N’ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa,

Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo.

35 Ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe,

Afọ-ha nēdozi kwa aghughọ.

Categories
JOB

JOB 16

1 Job we za, si,

2 Anuwom ọtutu ihe dika ihe ndia:

Ndi-nkasi-obi nēweta ọnọdu ọjọ ka unu nile bu.

3 Òkwu nke bu nání ifufe gēnwe ọgwugwu?

Ma-ọbu gini nēme gi ka i di irè, na i nāza okwu?

4 Ka mu onwem kwu kwa okwu dika unu;

Ọ buru na nkpuru-obi-unu adi n’ọnọdu nkpuru-obim,

M’gēnwe ike ijikọta okwu imegide unu,

Na ifufe isim imegide unu.

5 M’gēwere ọnum b͕a unu ume,

Nmeghari eb͕ub͕ere-ọnum gēb͕ochi kwa ihe-nb͕u-unu.

6 Ọ buru na ekwuem, adighi-eb͕ochi ihe-nb͕um:

Ma ọ buru na arapum, gini gēsi n’arum la?

7 Otú ọ di, ub͕u a O mewo ka ike gwum:

I mewo ka nzukọm nile ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu.

8 I we jisiem ike, ọ ghọwo ihe-àmà megidem:

Ọtita-arum we nēbili imegidem, Ọ nāzam n’iru.

9 Iwe-ya adọkawom O we kpọm asì;

Ọ takwasiwom ikekere ezé-Ya:

Onye-nkpab͕um nāchichapu anya-Ya n’arum.

10 Ha asaghepuwo ọnu-ha n’arum,

Were ita-uta tiem aka na ǹtì:

Ha nāchikọzu onwe-ha n’otù imegidem.

11 Chineke nēmechibidom uzọ nye ndi ajọ omume,

N’aka ndi nēmebi iwu ka Ọ nātubàkwam.

12 Anọm n’udo, O we mebiem;

Ọzọ, O jidewo olum, piajisiam,

Me ka m’biliere Onwe-ya ibu ihe O dotara ib͕a àkú.

13 Àkú-Ya nile dim buruburu,

Ọ nāb͕awa akurum, Ọ dighi-enwe kwa ọmiko n’arum;

Ọ nāwusi òlùlùm n’ala.

14 O nētipúm ntipú n’elu ntipú-ibe-ya;

Ọ nāb͕akwasim dika dike.

15 Ákwà-nkpe ka m’dukọtaworo n’elu akpukpọ-arum,

Turughari mpim n’ájá.

16 Irum nācha ọbara-ọbara site n’ikwa-ákwá,

Na mbubere-anyam ka onyinyo ọnwu di kwa;

17 Ọ bughi n’ihi na ihe-ike di n’ọbu-akam,

Ekperem di kwa ọcha.

18 Ala, ekpuchila ọbaram,

Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum.

19 Ọbuná ub͕u a, le, n’elu-igwe ka Onye-àmàm nọ,

Onye nēkwurum nọ kwa n’ebe di elu.

20 Ndi-eyìm bu ndi nākwam emò:

Ma ọ bu n’ebe Chineke nọ ka anyam nātusisi anya-miri;

21 Ka otù onye we so Chineke ruara madu uka,

Dika nwa nke madu si aruara madu-ibe-ya uka.

22 N’ihi na arọ ole-na-ole gābia,

M’we je n’uzọ m’gaghi-alaghachi.

Categories
JOB

JOB 17

1 Emebiwo mọm, emewo ka ubọchim gwusia,

Ílì dirim.

2 N’ezie ikwa-emò diyerem,

Anyam nānọ kwa ọnọdu-abali n’ikpasu-obi-ilu nile ha.

3 Biko, do ihe-ibe, burum onye-mbe n’ebe Gi onwe-gi nọ;

Ònye ka ọ bu, bú onye gānaram n’aka?

4 N’ihi na I zopuwo obi-ha n’inwe ezi uche:

N’ihi ya I gaghi-ebuli ha elu.

5 Onye nēgosi ndi-eyì-ya inara òkè,

Ọbuná anya umu-ya gādala n’isi.

6 Ọzọ, O guzowom dika ilu nke ndi nile di iche iche;

Onye ha nābusa ọnu-miri n’iru-ya ka m’ghọwo-kwa-ra.

7 Anyam we nāhu inyoghi-inyoghi site na nkpasu-iwe,

Ihe dim n’aru di ka onyinyo, ha nile.

8 Ibobo bayere nka gānwu ndi ziri ezi n’aru,

Onye nēmeghi ihe ọjọ gākpọte kwa onwe-ya imegide onye emeruru emeru.

9 Ma onye ezi omume gējisi ike n’iso uzọ-ya,

Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n’iru n’iru n’inwe ume.

10 Ma otú ọ di, biko, unu nile chigharia, bia:

Ma m’gaghi-achọta onye mara ihe n’etiti unu.

11 Ubọchim nile agabigawo, emebiwo nzubem nile,

Bú ihe-nnweta nke obim.

12 Ha nēdo abali n’ọnọdu ehihie:

Ha nāsi, Ìhè di nso iru ọchichiri.

13 Ọ buru na elem anya ala-mọ na ọ gābu ụlọm;

Ọ buru na ab͕asawom utem n’ọchichiri;

14 Ọ buru na akpọwom olùlù òkù, si, Nnam ka i bu;

Kpọ kwa ikpuru òkù, si, Nnem na nwa-nnem nwayi ka i bu;

15 Òle ebe kwa ka olile-anyam di ub͕u a?

Olile-anyam kwa, ònye gēkiri ya?

16 Rue ihe di n’ala-mọ ka ha gārida,

Ọ buru na izu-ike adirim otù mbe ahu n’ájá.

Categories
JOB

JOB 18

1 Bildad, bú onye Shua, we za, si,

2 Rùe ole mb͕e unu ganēsiri okwu ọnyà?

Ghọtanu, ma emesia ayi gēkwu.

3 Gini mere aguworo ayi ka anumanu?

Ayi aghọwo ndi ruru árú n’anya-unu.

4 Ọ nādọka onwe-ya n’iwe-ya.

Àgārapu uwa n’ihi gi?

Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n’ọnọdu-ya?

5 Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu,

Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.

6 Ìhè aghọwo ọchichiri n’ulo-ikwū-ya,

Agēmenyu kwa oriọna-ya n’elu ya.

7 Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya,

Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.

8 N’ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n’ub͕u eji eb͕u anu,

Ọ nējeghari kwa n’elu ihe-ntuhi.

9 Ib͕udu gādakwasi ya n’ikiri-ukwu,

Ọnyà gāma ya.

10 Ezobeworo ya udọ̀ n’ala,

Na ihe iji nwude ya n’elu uzọ.

11 Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu,

Ha we chugharia ya n’ukwu-ya.

12 Agu ganāgu ume-ya,

Edoziwo kwa nhuju-anya n’akuku-ya.

13 Ọ gēripia ihe di n’akpukpọ-aru-ya,

Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n’aru.

14 Agādọpusi ya ike n’ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya;

Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.

15 Ihe nābughi nke ya gēbi n’ulo-ikwū-ya:

Agēfesa brimstone n’elu ebe-obibi-ya.

16 Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n’okpuru,

Agēbipu kwa alaka-ya n’elu.

17 Ncheta-ya alawo n’iyì pua n’uwa,

Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n’èzí.

18 Agākwapu ya n’ihè ba n’ọchichiri,

Agēme kwa ka o si n’elu-uwa dum madu bi waghari.

19 Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n’etiti ndi-ya,

Ọ dighi kwa onye fọduru n’ọnọdu-ọbìa-ya nile.

20 Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n’akuku Ọdida-anyanwu n’aru,

Ndi bi n’akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ.

21 Otú ọ di, ndia bu ebe-obibi nke ajọ omume,

Nka bu kwa ebe onye nāmaghi Chineke.

Categories
JOB

JOB 19

1 Job we za, si,

2 Rùe ole mb͕e unu gēme ka nkpuru-obim rue újú?

Rùe ole mb͕e unu gēwere okwu zọpiam?

3 Ub͕ò iri ndia ka unu nēme ka ihere mem:

Ihere adighi-eme unu na unu nēmejọm.

4 Ọzọ kwa, ọ bu ezie na emehiewom n’amaghi-ama,

Ma n’ebe m’nọ ka nmehiem m’mehiere n’amaghi-ama di.

5 Ọ buru na ọ bu ezie na ọ bu imegidem ka unu nēme onwe-unu uku,

Ọ buru kwa na unu ewere ita-utam som ru uka:

6 Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m’bagọ ab͕agọ,

Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.

7 Le, anameti nkpu, si, Ihe-ike! ma adighi-azam:

Anametiku Chineke, ma ikpé adighi.

8 Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m’gaghi-agabiga kwa,

N’uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri.

9 O yipuwo nsọpurum n’arum dika uwe,

We wezuga okpu-eze n’isim.

10 Ọ nākwatum buruburu, m’we la:

O we ropu olile-anyam dika osisi.

11 O me ka iwe-Ya di ọku imegidem,

Ọ guaram Onwe-ya dika ndi nēmegide Ya.

12 Usu-Ya nile ndi nāpunara madu ihe nābiakọta, tulie uzọ-ha imegidem,

Ma kwa ulo-ikwū-ha buruburu ulo-ikwūm.

13 O mewo ka umu-nnem nọpurum n’ebe di anya,

Ndi maworom we ghọ nání ndi ala ọzọ n’ebe m’nọ.

14 Ndi-ab͕ata-obim akwusiwo,

Ndi m’mara echezọwokwam.

15 Ndi nọ n’ulom dika ọbìa na ndi-orum nwayi nāgum n’onye ala ọzọ:

Onye anāmataghi ka m’ghọworo n’anya-ha.

16 Akpọwom arùm òkù, ma ọ dighi-azam,

Anameji ọnum riọ ya aririọ-amara.

17 Iku-umem aghọwo iku-ume onye nābughi di-ya n’ebe nwunyem nọ,

Ariọwokwam umu afọ nnem aririọ-amara.

18 Ọbuná umu nāṅu ara ajuwom;

Ọ buru na ebiliem, ha we nēkwugidem.

19 Ndi-ìzum nile nākpọm ihe-árú:

Ndi ahu m’huru n’anya echighariwo imegidem.

20 Ọkpukpum nārapara n’akpukpọ-arum na n’anu-arum,

M’we were akpukpọ ezém wepuga onwem.

21 Merenum amara, merenum amara, unu onwe-unu, bú ndi-eyìm;

N’ihi na aka Chineke emetuwom n’aru.

22 N’ìhi gini ka unu nāchum dika Chineke?

N’ìhi gini ka anu-arum adighi-eju unu afọ?

23 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ede okwum nile n’akwukwọ ub͕u a!

Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na akà ha n’akwukwo!

24 Ma asi na eji pen ígwè na òpù

Ka ha n’oké nkume rue mb͕e ebighi-ebi!

25 Ma mu onwem amawo na Onye-nb͕aputam di ndu,

Na O gēbili kwa ọtọ n’elu ájá n’ikpe-azu:

26 Mb͕e emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka,

Ọ bu na m’gēsi n’anu-arum hu Chineke:

27 Onye mu onwem gāhuru onwem,

Anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bughi kwa onye ala ọzọ.

Akurum abua agwusiwo n’imem.

28 Ọ buru na unu asi, Àyi gēsi aṅa chu ya?

Ma achọtawo nkpọrọgwu okwu nimem;

29 Tuanu ujọ n’iru mma-agha:

N’ihi na ọnuma nēweta ahuhu-ajọ-omume nile nke mma-agha,

Ka unu we mara na ikpé di.

Categories
JOB

JOB 20

1 Zofa, bú onye Neama, we za, si,

2 N’ihi nka ka èchìchèm nāzaghachim,

Ọbuná n’ihi ime-ngwam nke di nimem.

3 Anuwom ọdidọ-aka-na-nti nke nētiyem n’ọnọdu-ihere,

Mọ nke nghọtam nāzakwam.

4 Ì mawo nka site na mb͕e ochie,

Site na mb͕e edoro madu n’elu uwa,

5 Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu,

Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?

6 Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe,

Isi-ya ewe metu igwe-oji;

7 Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n’iyì rue mb͕e ebighi-ebi:

Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?

8 Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya:

Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.

9 Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ;

Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.

10 Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye,

Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya.

11 Ọkpukpu-ya nile juputara n’ume okorọbia-ya,

Ma o gēso ya dina n’elu ájá.

12 Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n’ọnu-ya,

Ọ buru na o zobe ya n’okpuru ire-ya;

13 Ọ buru na o nwe ọmiko n’aru ya, we ghara irapu ya,

Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya;

14 Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo,

Ọ bu òlùlù aju-ala n’ime-ya.

15 O lodawo àkù, we b͕oputa ya:

Chineke gēsi n’afọ-ya napu ya àkù ahu.

16 Nsi aju-ala ka ọ gāmiri:

Ire agwọ gēb͕u ya.

17 Ọ gaghi-ele miri-iyi anya,

Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.

18 Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n’ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya;

Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.

19 N’ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha;

Ọ napuwo ulo n’ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.

20 N’ihi na ọ dighi-ama udo n’afọ-ya,

Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.

21 Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi;

N’ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.

22 N’ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya:

Aka onye ọ bula nke nọ n’ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.

23 Ka o rue, n’iriju afọ-ya,

Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya,

Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.

24 Ọ gēsi n’ihe-ekike-agha ígwè b͕alaga,

Uta ọla gāb͕apue ya.

25 Ọ dọputawo ya, o we si n’aru-ya puta:

Ọnu-ọnu-ya nke nēb͕upu àmùmà nēsi kwa n’òlùlù-ya puta;

Oké ujọ nile di n’aru ya.

26 Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba:

Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya;

Ọ gērechapu ihe fọduru n’ulo-ikwū-ya.

27 Elu-igwe gēkpughe ajọ omume-ya,

Ala nēbili kwa imegide ya.

28 Agēme ka ihe-omume nke ulo-ya je biri n’ala ọzọ,

Àkù-ya bu ihe anāwusi awusi n’ubọchi iwe-Ya.

29 Nka bu òkè madu nke nēmebi iwu site n’aka Chineke,

Na ihe-nketa-ya nke Chineke siri ya keta.