Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 41

1 O rue, n’ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, onye bu kwa otù nime ndi-isi nke eze, ya na-ndikom iri, biakutere Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa; ha we rikọ nri n’ebe ahu na Mizpa.

2 Ishmael nwa Netanaia we bilie, ya na ndikom iri ahu ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we were mma-agha tib͕ue Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we me ka ọ nwua, bú onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala ahu.

3 Ọ bu kwa ndi-Ju nile ndi ha na ya, bú Gedalaia, nọ, nime Mizpa, na ndi Kaldea ndi ahuru n’ebe ahu, bú ndi-agha, ka Ishmael tib͕uru.

4 O rue, n’ubọchi nke-abua mb͕e emesiri ka Gedalaia nwua, ma ọ dighi onye ọ bula mara ya,

5 na madu ufọdu siri na Shekem, si kwa na Shailo, si kwa na Sameria, bia, bú ọgu ndikom anọ, ndi akọpusiri afu-ọnu-ha, ndi uwe nile ha dọwara adọwa, ndi nēbì kwa onwe-ha mma, jide onyinye-inata-iru-ọma na frankincense n’aka-ha, iwebata ya n’ulo Jehova.

6 Ishmael nwa Netanaia we si na Mizpa pua izute ha, nēje ije nākwa ákwá: o rue, mb͕e o zutere ha, na ọ siri ha Biakutenu Gedalaia nwa Ahaikam.

7 O rue, mb͕e ha batara n’etiti obodo, na Ishmael nwa Netanaia b͕uru ha, tubà ha n’etiti olùlù, ya onwe-ya na ndikom ndi ya na ha nọ.

8 Ma achọtara ndikom iri n’etiti ha ndi siri Ishmael, Emela ka ayi nwua: n’ihi na ayi nwere àkù zoro ezo n’ọhia, bú ọka wheat, na ọka barley, na manu, na manu-aṅu. O we rapu, ghara ime ka ha nwua n’etiti umu-nne-ha.

9 Ma olùlù ahu ebe Ishmael tubàra ozu nile nke ndikom ahu ndi o tib͕uru, n’akuku Gedalaia, (olùlù ahu bú nke Esa, bú eze, mereri n’ihi Beasha, bu eze Israel,) olùlù ahu ka Ishmael nwa Netanaia were ndi eb͕uru eb͕u tujue.

10 Ishmael we dọta ndi Israel nile fọduru ndi nọ na Mizpa n’agha, bú umu-ndinyom eze, na ndi Israel nile fọduru na Mizpa, ndi Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta-ha: Ishmael nwa Netanaia we dọta ha n’agha, je igabigakuru umu Amon.

11 Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we nu ihe ọjọ ahu nile nke Ishmael nwa Netanaia mere,

12 ha we chiri ndikom-ha nile, je ibuso Ishmael nwa Netanaia agha, ha we chọta ya n’akuku miri bara uba nke di na Gibeon.

13 O rue, mb͕e ndi Israel nile ndi ha na Ishmael nọ huru Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi ya na ha nọ, ha we ṅuria ọṅu.

14 Ndi Israel nile ndi Ishmael siri na Mizpa dọta n’agha we chigharia, lata, jekuru Johanan nwa Karea.

15 Ma Ishmael nwa Netanaia chiri ndikom asatọ wepuga onwe-ya n’aka Johanan, jekuru umu Amon.

16 Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we chiri ndi Israel nile fọduru, bú ndi o mere ka ha si n’aka Ishmael nwa Netanaia lata, site na Mizpa, mb͕e o tib͕usiri Gedalaia nwa Ahaikam, bú ndikom, ndi bu ndi-agha, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-onozi, ndi o mere ka ha si na Gibeon lata:

17 ha we je, nọdu na Gerut Kimham, nke di n’akuku Bet-lehem, ije ba n’Ijipt,

18 n’ihi ndi Kaldea: n’ihi na ha turu egwu ha, n’ihi na Ishmael nwa Netanaia etib͕uwo Gedalaia nwa Ahaikam, onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala-ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 42

1 Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na Johanan nwa Karea, na Jezanaia nwa Hoshaia, na ndi Israel nile site n’onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, we biarue nso,

2 si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n’iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n’ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n’ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi:

3 ka Jehova, bú Chineke-gi, we gosi ayi uzọ ahu nke ayi gēje ije nime ya, na ihe ayi gēme.

4 Jeremaia, bú onye-amuma, we si ha, Anuwom; le, m’gaje ikpere Jehova, bú Chineke-unu, ekpere, dika okwu nile nke unu si di; ọ gēru kwa na ihe ọ bula nke Jehova gāza unu, m’gēgosi unu ya; m’gaghi-eb͕ochinari unu ihe ọ bula.

5 Ndi ahu we si Jeremaia, Ka Jehova buru onye-àmà nēkwu ezi-okwu nke kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi n’etiti ayi, ọ buru na ọ bughi dika okwu ahu nile si di, nke Jehova, bú Chineke-gi, gēzite gi ka i were ya biakute ayi, otú a ka ayi gēme.

6 Ma ọ di nma ma ọ jọrọ njọ, olu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēge nti, bú Onye ayi onwe-ayi nēziga gi ijekuru; ka o we diri ayi nma, mb͕e ayi nēge nti olu Jehova, bú Chineke-ayi.

7 O rue, mb͕e ubọchi iri gwusiri, na okwu Jehova ruru Jeremaia nti.

8 O we kpọ Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya, na ndi Israel nile site n’onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku,

9 si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, Onye unu zigaram ijekuru ime ka aririọ-amara-unu da n’iru Ya, siri:

10 Ọ buru na unu ebiri n’ala nka, M’gēwu kwa unu dika ulo, ghara ikwada unu, M’gāku kwa unu dika osisi, ghara iropu unu: n’ihi na echeghariwom n’ihe ọjọ ahu nke M’meworo unu.

11 Unu atula egwu eze Babilon, onye unu onwe-unu nātu egwu ya; unu atula egwu ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): n’ihi na unu ka M’nọyere, izọputa unu, na inaputa unu n’aka-ya.

12 M’gēnye kwa unu ka enwe obi-ebere nile n’aru unu, ka o we nwe obi-ebere n’aru unu, me ka unu lata n’ala-unu.

13 Ma ọ buru na unu onwe-unu asi, Ayi agaghi-ebi n’ala nka; unu ewe ghara ige nti olu Jehova, bú Chineke-unu;

14 si, É-è; kama ọ bu n’ala Ijipt ka ayi gābà, ebe ayi nāgaghi-ahu agha, ayi agaghi-anu kwa olu opì-ike, agu ihe-oriri agaghi-agu kwa ayi; ọ bu kwa n’ebe ahu ka ayi gēbi:

15 ma ub͕u a n’ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi Juda fọduru: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Ọ buru na unu onwe-unu edosie iru-unu ike ibà n’Ijipt, unu ewe ba inọ dika ọbìa n’ebe ahu;

16 ọ gēru kwa, na mma-agha ahu nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n’ebe ahu ka ọ gēru unu aru n’ala Ijipt; ọzọ, oké unwu ahu, nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n’ebe ahu ka ọ gārapara unu n’aru n’iso unu n’azu n’Ijipt; ọ bu kwa n’ebe ahu ka unu gānwu.

17 Ọ bu kwa otú a ka ndikom ahu nile gādi, bú ndi doworo iru-ha ibà n’Ijipt inọ dika ọbìa n’ebe ahu; ha gānwu site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe: ha agaghi-enwe kwa ndi fọduru ma-ọbu ndi b͕apuru ab͕apu n’iru ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ha.

18 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n’aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n’aru unu, mb͕e unu batara n’Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.

19 Jehova ekwuwo okwu bayere unu, unu ndi Juda fọduru, si, Unu abàla n’Ijipt: maranu nke-ọma na ab͕aworom unu àmà ta.

20 N’ihi na unu akpafuwo megide nkpuru-obi-unu; n’ihi na unu onwe-unu zigaram jekuru Jehova, bú Chineke-unu, si, Kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere; ọzọ, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāsi, gi gosi ayi otú a, ayi gēme kwa ya:

21 m’we gosi unu ya ta; ma unu egeghi nti n’olu Jehova, bú Chineke-unu, ọbuná ime ihe ọ bula nke O zìrim ka m’were ya biakute unu.

22 Ma ub͕u a maranu nke-ọma na ọ bu site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe, ka unu gānwu n’ebe ahu nke ọ nātọ unu utọ ije nọ dika ọbìa n’ebe ahu.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 43

1 O rue, mb͕e Jeremaia gwabìri ndi Israel nile okwu nile nke Jehova, bú Chineke-ha, nke Jehova, bú Chineke-ha, zigara ya ka o were ha jekuru ha, bú okwu ndia nile,

2 Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n’Ijipt inọ dika ọbìa n’ebe ahu:

3 kama Beruk nwa Neraia nākpali gi imegide ayi, ka o we nye ayi n’aka ndi Kaldea, ka ha we me ka ayi nwua, me kwa ka ayi je biri na Babilon.

4 Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na ndi Israel nile, we ghara ige nti olu Jehova, ibi n’ala Juda.

5 Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, we chiri ndi Juda nile fọduru, bú ndi siri na mba nile ebe achugara ha-ri lata inọ dika ọbìa n’ala Juda;

6 bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na umu-ndinyom eze, na madu ọ bula nke Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ọ nọdu n’aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, na Jeremaia, bú onye-amuma, na Beruk nwa Neraia;

7 ha we ba n’ala Ijipt; n’ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ha we biarue Tahpanhes.

8 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti na Tahpanhes, si,

9 Were nkume di uku n’aka-gi, zobe ha n’urọ n’ebe ahu anākpu brick nke di n’ọnu-uzọ ulo Fero na Tahpanhes, n’anya ndi Juda;

10 si ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M’gaje iziga kuru Nebukadreza, eze Babilon, bú orùm, dọkwasi oche-eze-ya n’elu nkume ndia nke m’zobeworo; ọ gēseti kwa ulo-ǹdò-ya n’elu ha.

11 Ọ gābia kwa, tib͕ue ala Ijipt; ndi diri ọnwu ka agēnye n’ọnwu, ndi diri ndọta-n’agha ka agēnye na ndọta-n’agha, ndi diri mma-agha ka agēnye na mma-agha.

12 M’gēsuye kwa ọku n’olu nile nke chi nile nke Ijipt; o gēsure kwa ha ọku, dọta ha n’agha: ọ gēji kwa ala Ijipt kpuchie onwe-ya dika onye-ọzùzù-aturu si eji uwe-ya kpuchie onwe-ya; o gēsi kwa n’ebe ahu pua n’udo.

13 O gētipia kwa ogidi nile nke ulo anyanwu, nke di n’ala Ijipt; ọ bu kwa ulo nile nke chi nile nke Ijipt ka ọ gēsure n’ọku.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 44

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi-Ju nile ndi bi n’ala Ijipt, ndi bi na Migdol, na nime Tahpanhes, na nime Nof, na n’ala Patros, si,

2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu onwe-unu ahuwo ihe ọjọ ahu nile nke M’meworo ka ọ biakwasi Jerusalem, biakwasi kwa obodo nile nke Juda; ma, le, ha bu nkpọnkpọ ebe ta, ọ dighi kwa onye bi nime ha;

3 n’ihi ihe ọjọ ha nke ha meworo ikpasum iwe, n’ije isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ifè chi ọzọ di iche iche, ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha, ma-ọbu unu onwe-unu, ma-ọbu nna-unu-hà.

4 M’we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n’isi-ututu nēzite ha, si, Biko, unu emela ihe-árú a nke M’kpọworo asì.

5 Ma ha anughi, ha atọghi kwa nti-ha n’ala isi n’ihe ọjọ ha chigharia, ighara isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

6 Ewe wusi ọnumam na iwem, o we re ọku n’obodo nile nke Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem; ha we ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe tọb͕ọrọ n’efu, dika o si di ta.

7 Ma ub͕u a otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N’ìhi gini ka unu onwe-unu nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi unu, ibipu n’ulo-unu nwoke na nwanyi na nwatakiri na nwa nāṅu ara, ka ha pua n’etiti Juda, ewe me ka ọ ghara idi ndi fọduru gāfọduru unu;

8 n’iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n’isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n’etiti mba nile nke uwa?

9 Ùnu echezọwo ihe ọjọ nile nke nna-unu-hà, na ihe ọjọ nile nke ndi-eze Juda, na ihe ọjọ nile nke ndinyom-ha, na ihe ọjọ nile nke unu, na ihe ọjọ nile nke ndinyom-unu, nke ha mere n’ala Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem?

10 Azọpiaghi ha n’obi rue ta, ha atughi kwa egwu, ha ejegharighi kwa n’iwum, na n’ukpurum nile, nke M’tiyere n’iru unu na n’iru nna-unu-hà.

11 N’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M’gaje ido irum imegide unu ime unu ihe ọjọ, ọbuná ibipu Juda nile.

12 M’gēwere kwa ndi Juda fọduru, bú ndi doworo iru-ha ibà n’ala Ijipt inọ dika ọbìa n’ebe ahu, agēme kwa ka ha nile gwusia; n’ala Ijipt ka ha gāda; site na mma-agha na site n’oké unwu ka agēme ka ha gwusia: ha gānwu, site n’onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, site na mma-agha na site n’oké unwu: ha gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta.

13 M’gēji kwa nmehie nke ndi bi n’ala Ijipt leta ha, dika M’jiworo nmehie nke Jerusalem leta ya, site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe:

14 ọ gaghi-adi kwa onye-nb͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu ndi Juda fọduru gēnwe, bú ndi bataworo n’ala Ijipt inọ dika ọbìa n’ebe ahu, ọbuná ilaghachi n’ala Juda, nke ha onwe-ha nāchọ si-ike ilaghachi ibi n’ebe ahu: n’ihi na ọ dighi onye gālaghachi ma-ọbughi ndi b͕apuru ab͕apu.

15 Ndikom ahu nile ndi mara na ndinyom-ha nēsurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ndinyom nile ndi nēguzo n’ebe ahu, ọ bu nkpọkọta di uku, ọbuná ndi Israel nile ndi bi n’ala Ijipt, nime Patros, ha we za Jeremaia, si,

16 Okwu ahu nke i gwaworo ayi n’aha Jehova, ayi agaghi-adi nēge gi nti.

17 Kama ayi aghaghi ime okwu nile ọ bula nke puworo n’ọnu-ayi, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, dika ayi meworo, ayi onwe-ayi, na nna-ayi-ha, na ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, n’obodo nile nke Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem: ayi we rijue nri afọ, aru adi ayi nma, ọ dighi kwa ihe ọjọ ayi huru.

18 Ma site na mb͕e ayi rapuru isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nile akọwọ ayi, ọ bu kwa site na mma-agha na site n’oké unwu ka emeworo ka ayi gwusia.

19 Ma mb͕e ayi onwe-ayi nēsurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāwusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bu mb͕e di-ayi nēkweghi ka ayi meworo ob͕e achicha nye ya ime onyinyo-ya, wusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu?

20 Jeremaia we gwa ndi Israel nile, ma ndikom ma ndinyom, ọbuná ndi Israel nile ndi nāza ya okwu, si,

21 Ọ̀ bughi ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke unu surere n’obodo nile nke Juda na n’èzí nile nke Jerusalem, unu onwe-unu, na nna-unu-hà, na ndi-eze-unu, na ndi-isi-unu, na ndi ala ahu, ọ̀ bughi ihe ndia ka Jehova chetara, ihe ahu we bata n’obi-Ya?

22 Jehova apughi kwa inagide kwa ọzọ, n’ihi ihe ọjọ nke omume nile unu, n’ihi ihe-árú nile nke unu meworo; ala-unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, ghara inwe onye-obibi, dika o si di ta.

23 N’ihi na unu esurewo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na n’ihi na unu emehiewo megide Jehova, we ghara ige nti olu Jehova, ghara kwa ijeghari n’iwu-Ya, na n’ukpuru-Ya nile, na n’ihe-àmà-Ya nile; n’ihi nka ka ihe ọjọ a dakwasiworo unu, dika o si di ta.

24 Jeremaia we si ndi Israel nile, si kwa ndinyom ahu nile, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi nọ n’ala Ijipt:

25 otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si: Unu onwe-unu na ndinyom-unu ji ọnu-unu ekwu okwu, ọ bu kwa aka-unu ka unu jiworo mezu ya, si, Ayi aghaghi ime nkwa nile ayi nke ayi kweworo, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu: menu ka nkwa nile unu guzosie ike n’ezie, me-kwa-nu ihe nile unu kwere na nkwa n’ezie.

26 N’ihi nka nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi bi n’ala Ijipt: Le, Mu onwem ewerewo aham di uku ṅua iyi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na aham agaghi-abu kwa ọzọ ihe anākpọ n’ọnu onye ọ bula nke Juda n’ala Ijipt nile, si, Onye-nwe-ayi Jehova nādi ndu.

27 Le, Mu nāmu anya n’aru ha ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha nma: agēme kwa ka ndi Juda nile, bú ndi nọ n’ala Ijipt, gwusia site na mma-agha na site n’oké unwu, rue mb͕e ha gāgwusi.

28 Ma ndi b͕apuworo na mma-agha gēsi n’ala Ijipt laghachi n’ala Juda, ndikom ole-na-ole; ndi Juda nile fọduru, bú ndi biaruworo ala Ijipt inọ dika ọbìa n’ebe ahu, ewe mara onye okwu-ya gēguzosi ike, nkem, ma-ọbu nke ha.

29 Ma nka gāburu unu ihe-iriba-ama, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na Mu onwem nēji nmehie-unu leta unu n’ebe a, ka unu we mara na okwum nile aghaghi iguzosi ike imegide unu ime unu ihe ọjọ:

30 otú a ka Jehova siri: Le, M’gaje inye Fero Họfra, bú eze Ijipt, n’aka ndi-iro-ya, na n’aka ndi nāchọ ndu-ya; dika M’nyere Zedekaia, bú eze Juda, n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon, bú onye-iro-ya, nke nāchọ kwa ndu-ya.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 45

1 Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara Beruk nwa Neraia, mb͕e o dere okwu ndia n’akwukwọ site n’ọnu Jeremaia, n’arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si,

2 Okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere gi, Beruk, si:

3 I siri, Biko, ahuhu nādirim! n’ihi na Jehova atukwasiwo ihe-nwuta n’elu ihe-nb͕um; adọb͕uwom onwem n’ọlu n’ize-umem, ma achọtaghm izu-ike.

4 Otú a ka i gāsi ya, Otú a ka Jehova siri: Le, ihe nke M’wuworo ka Mu onwem nākwada, ọzọ, ihe nke M’kuworo n’ubi ka Mu onwem nēropu; ọbuná ala nka nile, nkem ka ọ bu.

5 Ma gi onwe-gi, ì nāchọrọ onwe-gi ihe uku? achọla ha: n’ihi na, le, M’gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi anu-aru nile, bú madu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): ma M’gēnye gi ndu-gi ka ọ buru ihe-nkwata n’ebe nile i gēje.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 46

1 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere mba nile.

2 Nke diri Ijipt: bayere usu-ndi-agha nke Fero-neko, bú eze Ijipt, nke di n’akuku osimiri Yufretis nime Kakemish, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru n’arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda.

3 Donu ọta na ọta uku n’usoro, biaru-kwa-nu nso ibu agha.

4 Kegidenu inyinya n’ub͕ọ-ala, rikwasinu, unu ndi-inyinya, guzo-kwa-nu onwe-unu nēkpu okpu-agha; richanu ube-unu, yirinu uwe-agha-unu.

5 Gini mere m’huworo ya? ndi ahu nātu ujọ b͕aghachi azu; anētipia kwa ndi-dike-ya, ha ab͕alagawo kwa ngwa ngwa, we ghara ile anya n’azu: egwu di buruburu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

6 Ka onye nwere ukwu ọsọ ghara ib͕alaga, ka dike ghara kwa iwepuga onwe-ya; n’Ugwu n’akuku osimiri Yufretis ka ha suru ngọngọ, da.

7 Ònye bu onye a? dika osimiri Nail ka ọ nērú, dika osimiri ka miri-ya nile nāmaghari.

8 Ijipt nērú dika osimiri Nail, ọ bu kwa dika osimiri ka miri-ya n’amaghari: o we si, M’gārigo, kpuchie uwa; m’gēme ka obodo na ndi bi nime ya la n’iyì.

9 Rigonu, unu inyinya; kpọtuanu nkpọtu, unu ub͕ọ-ala; ka ndi-dike puta kwa: Kush na Put, ndi nēji ọta; na Ludim, ndi nēji nāzọ kwa uta ukwu ikwe ya.

10 Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n’ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n’ala Ugwu n’akuku osimiri Yufretis.

11 Rigorue Gilead, nara balm, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Ijipt: n’efu ka i meworo ka ọgwu ba uba; ọ dighi ọgwu-ntechi i nwere.

12 Mba nile anuwo ihere-gi, iti-nkpu-gi juputa-kwa-ra uwa: n’ihi na dike asukwasiwo dike ngọngọ, n’otù ka ha dakọworo, ha abua.

13 Okwu ahu nke Jehova gwara Jeremaia, bú onye-amuma, bayere ọbibia nke Nebukadreza, bú eze Babilon, itib͕u ala Ijipt.

14 Gosinu n’Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n’ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi.

15 Gini mere eji zachapu onye nke gi di ebube? o guzoghi, n’ihi na Jehova kwaturu ya.

16 O mere ka ndi nāsu ngọngọ di ọtutu, e, otù onye dakwasiri ibe-ya: ha we si, Bilie, ka ayi laghachikuru ndi-ayi, laghachi kwa n’ala amuru ayi, pua n’iru mma-agha nēme ihe-ike.

17 Ha kpọrọ nkpu n’ebe ahu, si, Fero, bú eze Ijipt, bu nání nkpọtu; o kwerewo ka mb͕e akara àkà gabiga.

18 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya), n’ezie dika Teboa n’etiti ugwu nile, na dika Kamel n’akuku oké osimiri, otú a ka ọ gābia.

19 Mere onwe-gi ihe nile iji je biri n’ala ọzọ, gi ada nēbi n’Ijipt: n’ihi na Nof gāghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, esuresiwo kwa ya ọku, o we ghara inwe onye-obibi.

20 Nwa-ab͕ọghọ-ehi mara nma nke-uku ka Ijipt bu; odudo nke sitere n’Ugwu abiawo, ọ biawo.

21 Ọzọ, ndi-ya egoro agha ndi nọ n’etiti ya di ka umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba; n’ihi na ha onwe-ha elewo anya n’azu, ha ab͕alagawo n’otù, ha eguzogh: n’ihi na ubọchi nhuju-anya-ha abiakwasiwo ha, bú mb͕e nleta-ha.

22 Olu-ya di ka mkpatu agwọ mb͕e ọ nāga; n’ihi na ha gāchiri usu-ndi-agha je ije, ha achiriwo kwa anyu-ike biakute ya, dika ndi-ọwa-nkú.

23 Ha gēb͕utu oké ọhia-ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), n’ihi na agaghi-eleputa ya; n’ihi na ha di ọtutu kari igurube, ha adighi kwa ọnu-ọgugu.

24 Agēme ka ihere me ada Ijipt; agēnye ya n’aka ndi Ugwu.

25 Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M’gaje iji nmehie-ha leta Amon nke No, leta kwa Fero, leta kwa Ijipt, leta kwa chi-ya nile, leta kwa ndi-eze-ya; ọbuná Fero, na ndi nātukwasi ya obi:

26 M’gēnye kwa ha n’aka ndi nāchọ ndu-ha, na n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n’aka ndi-orù-ya: ma emesia agēbi ya, dika o si di n’ubọchi nile nke mb͕e ochie; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

27 Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n’ihi na, le, M’gaje izọputa gi n’ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n’ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n’aru mgbū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.

28 Gi onwe-gi atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); n’ihi na gi ka M’nọyere: n’ihi na M’gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M’chugaworo gi, ma gi ka M’nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M’gādọ gi aka na nti n’ikpé, M’gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 47

1 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ndi Filistia, tutu Fero etib͕ue Geza.

2 Otú a ka Jehova siri: Le, miri nēsi n’Ugwu erú, ha gāghọ kwa miri-iyi nērubiga ókè, ha gērusa kwa ala na ùjú-ya, na obodo na ndi bi nime ya: madu ewe tie nkpu, ndi nile bi n’ala ahu gākwasi kwa ákwá ike.

3 Site n’olu ọzuzọ nke ukwu inyinya-ya nile di ebube, site na nkpọtu ub͕ọ-ala-ya, na ùzù nke wheel-ya nile, ndi bu nna eleghi anya n’azu ilekwasi umu-ha n’ihi aka kudara akuda;

4 n’ihi ubọchi ahu nke nābia ipunara ndi Filistia nile ihe-ha, ibipu na Taia na ibipu na Zaidon onye-iye-aka ọ bula nke fọduru: n’ihi na Jehova nāpunara ndi Filistia ihe, bú ndi agwe-etiti Kaftoa fọduru.

5 Nkwọcha-isi abiakwasiwo Geza; emewo ka Ashkelon dere du, bú ndi ndagwurugwu-ha fọduru: rùe ole mb͕e ka i gēbì onwe-gi mma?

6 A, gi mma-agha Jehova nwere, rùe ole mb͕e ka i gāghara idi jū? miye onwe-gi n’ọbọ-gi; doro aru ala, dere du.

7 Ì gesi aṅa di jū, ebe Jehova nyeworo gi iwu? imegide Ashkelon, na imegide ọnu-miri nke oké osimiri, n’ebe ahu ka Ọ kaworo ya.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 48

1 Nke diri Moab. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ahuhu diri Nebo! n’ihi na emebiwo ya; emewo ka ihere me Kiriataim, ewerewo ya: emewo ka ihere me Misgab, ọ nātu kwa ujọ.

2 Ọ dighi kwa otuto Moab di ọzọ; nime Heshbon ka ha chèputara èchìchè ọjọ megide ya, si, Bianu, ka ayi bipu ya ka ọ ghara ibu mba. Gi Madmen, agēme kwa ka i dere du; gi ka mma-agha gējeso.

3 Ge nti olu iti-nkpu nke siri na Horonaim puta, ọ bu ipunara-madu-ihe na ntikpọ uku!

4 Etikpọwo Moab; ndi-ntà-ya emewo ka anuru iti-nkpu.

5 N’ihi na nrigo Luhit ka o ji ikwa-ákwá nārigo nākwa ákwá; n’ihi na nime nrida Horonaim ka ha nuworo nkpà nke iti-nkpu nke ntikpọ.

6 B͕alaganu, wepuganu onwe-unu, di-kwa-nu ka osisi tamarisk n’ọzara.

7 N’ihi na ọ bu n’ihi na i tukwasiwo obi-gi n’ọlu-gi nile na n’àkù-gi nile ka agēwere kwa gi onwe-gi: Kemosh gāpu kwa so ndi gēje biri n’ala ọzọ, na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n’otù.

8 Onye nāpunara madu ihe gābiaru kwa obodo nile ọ bula, ọ dighi kwa obodo ọ bula gēwepuga onwe-ya; ndagwurugwu gāla kwa n’iyì, agēme kwa ka ala di lari tọb͕ọrọ n’efu; dika Jehova siri.

9 Nyenu Moab nkù, n’ihi na ọ ghaghi ifepu efepu: obodo-ya nile gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n’efu, ghara inwe onye bi nime ha.

10 Onye anābu ọnu ka onye nke ji aghughọ eje ozi Jehova bu, onye anābu ọnu ka onye nke nēb͕opu mma-agha-ya n’ọbara bu kwa.

11 Onye nānọ jū ka Moab bu site na mb͕e ọ di na nwata, ọzọ, manya-vine doro edo ka ọ bu, esighi kwa n’otù ihe b͕aye ya n’ihe ọzọ, o jeghi kwa n’etiti ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ: n’ihi nka ka utọ-ya guzoworo nime ya, ísì-ya ab͕anweghi kwa.

12 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gēzigara ya ndi nērulata ite manya-vine, ha ewe rulata ya; ọ bu kwa ihe manya-vine ya nile ka ha gāb͕apu, ọ bu kwa ite nile ha ka ha gātupia.

13 Ihere Kemosh gēme kwa Moab, dika ihere Bet-el, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, mere ulo Israel.

14 Ùnu si aṅa si, Ndi-dike ka ayi bu, na ndi bu dìnkpà ibu agha?

15 Emebiwo Moab, obodo-ya nile akwugowo kwa n’anwuru-ọku umu-okorọbia-ya arọputara arọputa aridawo kwa n’ob͕ub͕u, ọ bu ihe si n’ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

16 Nhuju-anya Moab di nso ibia, ihe ọjọ ya nēme kwa ngwa nke-uku.

17 Gosinu ya ebere unu nwere n’aru ya, unu ndi nile ndi nọ ya buruburu, na unu nile ndi mara aha-ya; sinu, Èsi aṅa b͕aji nkpa-n’aka di ike, bú ndele mara nma?

18 Si na nsọpuru-gi rida, nọdu ala n’akpiri-ikpọ-nku, gi ada nke bi na Dibon; n’ihi na onye nāpunara Moab ihe-ya arigowo imegide gi, o biliwo ebe-gi nile ewusiri ike.

19 Guzo n’uzọ, che nche, gi nwanyi bi n’Aroa: jua onye nāb͕alaga na nwanyi nke nēwepuga onwe-ya; si, Gini mere?

20 Emewo ka ihere me Moab; n’ihi na ọ tuwo ujọ: kwasie ákwá ike ti kwa nkpu; gosinu ya n’Anon, na emebiwo Moab.

21 Ikpé abiaruwo kwa ala nke bu ala di lari; rue Holon, ru kwa Jahza, ọ biakwasiwo kwa Mefaat;

22 biakwasi kwa Dibon, biakwasi kwa Nebo, biakwasi kwa Bet-diblataim;

23 biakwasi kwa Kiriataim, biakwasi kwa Bet-gamul, biakwasi kwa Bet-meon;

24 biakwasi kwa Keriot, biakwasi kwa Bọzra, biakwasi kwa obodo nile nke ala Moab, nke di anya ma-ọbu nke di nso.

25 Ebipuwo mpi Moab, ab͕ajiwo kwa ogwe-aka-ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta).

26 Menu ya ka ọ ṅubiga manya ókè; n’ihi na ọ bu Jehova ka o mere onwe-ya ka ọ di uku megide: Moab gāturu kwa onwe-ya n’ihe ọ b͕ọrọ, ọ gāghọ kwa ihe-ọchì, ọbuná ya onwe-ya.

27 N’ihi na Israel, ọ̀ bughi ihe-ọchì ọ buru gi? ọ̀ bu n’etiti ndi-ori ka achọtara ya? n’ihi na ka mb͕e ra i nēkwu okwu bayere ya, i nēfufe isi-gi.

28 Rapunu obodo nile, we biri na nkume di elu, unu ndi bi na Moab; di-kwa-nu ka nduru nke nālu akwu-ya n’ofè ọnu olùlù.

29 Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere idi-elu-ya, na npako-ya, na nganga-ya, na nbuli-elu nke obi-ya.

30 Mu onwem mara nrubiga-ókè-iwe-ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na ihe nēzighi ezi ka ọ bu; ekwukwu-ya nile, ihe nēzighi ezi ka ha meworo.

31 N’ihi nka ka m’gākwasiri Moab ákwá ike; e, ọ bu Moab nile ka m’gētiri nkpu: bayere ndi Kia-heres ka agātamu ntamu.

32 Ákwá nke kariri ákwá Jeza ka m’gākwara gi, gi osisi vine nke Sibma: alaka-gi nile gabigara oké osimiri, ọbuná n’oké osimiri nke Jeza ka ha ruru: n’elu nghọkọta-nkpuru-gi na n’elu nghọrọ-nkpuru-vine-gi ka onye nke nāpunara madu ihe daworo.

33 Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọṅù n’ubi ọma na n’ala Moab; emewokwam ka manya-vine kwusi n’ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile: ọ dighi onye gēji iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine zọcha nkpuru-vine; iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine agaghi-abu iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine.

34 Site n’iti-nkpu Heshbon rue Eleale, rue Jehez ka ha mere ka olu-ha da, site na Zoa rue Horonaim, rue Eglat-shelishiya: n’ihi na ọbuná miri Nimrim gāghọ nání ebe tọb͕ọrọ n’efu.

35 M’gēme kwa ka ọ kwusiri Moab, bú onye nēsure àjà-nsure-ọku n’ebe di elu, na onye nēsurere chi di iche ya ihe-nsure-ọku nesì ísì utọ; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

36 N’ihi nka obim nādara Moab udà dika ọ̀jà, obim nāda-kwa-ra ndi Kia-heres udà dika ọ̀jà: n’ihi nka ihe o nwebigara ókè nke o nwetara alawo n’iyì.

37 N’ihi na isi nile ọ bula kwọchara akwọcha, ọ bu kwa afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo: n’aka nile ka obibì-mma dikwasi, n’úkwù nile ka ákwà-nkpe di kwa.

38 N’elu-ulo nile nke Moab na n’amá-ya nile, n’ebe nile ọ bula, ka iti-aka-n’obi di: n’ihi na etiwawom Moab dika ihe nātọghi utọ; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

39 Le ka esi tipia ya nke-uku! ha akwasiwo ákwá ike. Le ka Moab si b͕akuta azu n’ihere nke-uku! Moab aghọwo-kwa-ra ndi nile di ya buruburu ihe-ọchì na ihe-itu-ujọ.

40 N’ihi na otú a ka Jehova siri: Le, dika ugo ka ọ gēfesi ike, b͕asa nkù-ya abua rue Moab.

41 Ewerewo Keriot, anarawo kwa ebe nile ewusiri ike, obi ndi-dike Moab n’ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.

42 Agēkpochapu kwa Moab ka ọ ghara ibu otù ndi, n’ihi na ọ bu imegide Jehova ka ọ meworo onwe-ya ka ọ di uku.

43 Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi na Moab; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

44 Onye ahu nke nāb͕apu n’iru oké egwu ahu gādabà n’olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n’òlùlù ahu, agējide ya n’ib͕udu ahu: n’ihi na M’gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

45 N’okpuru ndò Heshbon ka ndi nāb͕alaga guzoworo nēnweghi ike: n’ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, na ire-ọku site n’etiti Saihon, o we ripia akuku Moab, na opu-n’isi nke umu nkpọtu.

46 Ahuhu diri gi, Moab! ndi Kemosh alawo n’iyì: n’ihi na achiriwo umu-gi ndikom la na ndọta-n’agha, achiriwo kwa umu-gi ndinyom la na ndọta-n’agha.

47 Ma M’gēme ka ndi Moab adọtara n’agha laghachi n’ikpe-azu nke ubọchi nile; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta. Rue ebe a bu ikpé Moab.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 49

1 Nke diri umu Amon. Otú a ka Jehova siri: Ọ̀ dighi umu-ndikom Israel nwere? ọ̀ dighi onye-nnweta ihe-ya o nwere? Gini mere Malkam ji nweta Gad, ndi-ya we biri n’obodo-ya nile?

2 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gēme ka anuru udà-opì agha rue Raba nke umu Amon; ọ gāghọ kwa obo ebe tọb͕ọrọ n’efu, ọ bu kwa umu-ya ndinyom ka agēji ọku sure: Israel ewe nweta ndi nwetara ya-ri; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

3 Kwasie ákwá ike, gi Heshbon, n’ihi na apunarawo Ai ihe-ya; tienu nkpu, unu umu-ndinyom nke Raba, kenu ákwà-nkpe n’úkwù: tienu aka n’obi, b͕aghari-kwa-nu n’ogige nile unu; n’ihi na Malkam gāla n’etiti ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ya na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n’otù.

4 Gini mere i ji ndagwurugwu nile anya isi? ndagwurugwu-gi nērùpu dika miri, gi ada nke nādaghachi azu, nke nātukwasi obi n’àkù-ya nile, si, Ònye gābiakutem?

5 Le, M’gaje ime ka oké egwu biakwasi gi, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta), site na ndi nile nọ gi buruburu; agāchupu kwa unu, onye ọ bula n’iru ya, ọ gaghi-adi kwa onye nāchikọta onye ọ bula nāwaghari.

6 Ma emesia M’gēme ka umu Amon adọtara n’agha laghachi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

7 Nke diri Edom. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Amam-ihe, ọ̀ dighi kwa na Timan ọzọ? ndum-ọdu, ọ̀ lanariwo ndi-nghọta n’iyì? amam-ihe-ha, àwusiwo ya?

8 B͕alaganu, chigharia, biri n’ebe di omimi, unu ndi bi na Dedan; n’ihi na nhuju-anya Isọ ka M’gēme ka ọ biakwasi ya, mb͕e M’gēleta ya.

9 Ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ? ọ buru na ndi-ori abia n’abali, hà agaghi-ebibi nke gēzuru ha?

10 N’ihi na Mu onwem ab͕abawo Isọ ọtọ, ekpughepuwom ebe-nzuzo-ya nile, ọ pughi kwa izobe onwe-ya: apunariwo nkpuru-ya na umu-nne-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ha, ọ dighi kwa ndu.

11 Rapu umu-nb͕ei-gi, Mu onwem gēdebe ha ndu; ka ndinyom-i di-ha nwuru tukwasim obi-ha.

12 N’ihi na otú a ka Jehova siri: Le, ndi anēkpeghi ikpe iṅu n’iko ahu aghaghi iṅu; ma gi onwe-gi, ì gābu kwa onye ahu nke anāmaghi ikpe ma-ọli? I gaghi-abu onye anāmaghi ikpe, n’ihi na i ghaghi iṅu.

13 N’ihi na Onwem ka M’jiri ṅu iyi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na ihe-iju-anya na ihe-ita-uta na nkpọnkpọ ebe na ihe-nkọcha ka Bọzra gāghọ; obodo-ya nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe mb͕e ebighi-ebi.

14 Akukọ ka m’nuworo sitere na Jehova, ọ bu kwa ukọ̀ ka ezigaworo n’etiti mba nile, si, Chikọtanu onwe-unu, bia imegide ya, bili-kwa-nu ibu agha.

15 N’ihi na, le, mba di ntà ka M’meworo gi n’etiti mba nile, bú ihe-nlelì n’etiti madu.

16 Idi-egwu-gi, nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume ahu di elu, onye nējide ebe di elu nke ugwu ntà: n’ihi na asi na i me akwu-gi ka ọ di elu dika nke ugo, M’gēme ka i si n’ebe ahu ridata; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

17 Edom gāghọ kwa ihe-iju-anya: o gēju onye ọ bula nke nāgabiga n’akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n’ihi ihe-otiti-ya nile.

18 Dika nkwatu nke Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ọ dighi onye ọ bula gēbi n’ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.

19 Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebeita-nri nādigide mb͕e nile: ma n’otù ntabi-anya ka M’gēme ka o si n’aru-ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara arọputa? onye-nlekọta-ya ka M’gēme ya: n’ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n’irum?

20 N’ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Edom; na èchìchè-Ya nile, nke O chèworo megide ndi bi na Timan, si: N’ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu; n’ezie o gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha.

21 Site n’olu nke ọdida-ha uwa mara jijiji; iti-nkpu di, n’Oké Osimiri Uhie ka anuru olu-ya.

22 Le, dika ugo ka ọ gārigo, fesie ike, b͕asa nkù-ya n’elu Bọzra: obi ndi-dike Edom n’ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.

23 Nke diri Damaskọs. Ihere emewo Hemat na Apad; n’ihi na akukọ ọjọ ka ha nuworo, ha ab͕azewo: n’oké osimiri ka ncheb͕u di; ọ pughi inọ jū.

24 Damaskọs aghọwọ onye-ume-ngwu, o lewo anya n’azu ib͕alaga, ọma-jijiji ejidewo kwa ya: nkpà na ihe-nb͕u di iche iche ejidesiwo kwa ya ike, dika nke nwanyi ime nēme.

25 Èsi aṅa ghara irapu obodo nke otuto, bú obodo nke obi-utọm?

26 N’ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n’amá-ya nile, ọ bu kwa ndi-agha-ya nile ka agēme ka ha dere du n’ubọchi ahu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

27 M’gēsuye kwa ọku na mb͕idi Damaskọs, ọ gēripia kwa ulo nile di elu nke Ben-hedad.

28 Nke diri Kida, di-kwa-ra ala-eze nile nke Hezoa, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru.

Otú a ka Jehova siri: Bilienu, rigorue Kida, punara umu Iru-anyanwu ihe-ha.

29 Ulo-ikwū nile ha na ìgwè ewu na aturu-ha ka ha gāchiri; ákwà-nkwuba nile ha na ihe nile ha na camel nile ha ka ha gēbupuru onwe-ha: ha gākpọ nkpu bayere ha, si, Ujọ di buruburu.

30 B͕alaganu, wagharia nke-uku, biri n’ebe di omimi, unu ndi bi na Hezoa, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); n’ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, aduwo ọdu megide unu, ọ chèwo kwa èchìchè megide unu.

31 Bilienu, rigorue mba nke nọ n’udo, nke bi na ntukwasi-obi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); nke nēnweghi ọnu-uzọ ma-ọbu ihe-ntuchi, nání ha nēbi.

32 Camel nile ha gāghọ kwa ihe-nluta-n’agha, ìgwè anumanu-ha gāghọ kwa ihe-nkwata: M’gēfesa-kwa-ra ifufe nile ndi akọpuworo usọ isi-ha; ọ bu kwa n’ofè-ya nile ka M’gēme ka nhuju-anya-ha si bia; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

33 Hezoa gāghọ kwa ebe-obibi nkita-ọhia, bú ebe tọb͕ọrọ n’efu rue mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi onye ọ bula gēbi n’ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.

34 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere Ilam na mb͕e mbu nke ọbubu-eze nke Zedekaia, bú eze Juda, si,

35 Otú a ka Jehova nke usu nile ndi-agha siri: Le, M’gaje ib͕aji uta Ilam, bú isi ihe nke idi-ike-ha.

36 M’gēme kwa ka ifufe anọ si na nsọtu anọ nke elu-igwe biakute Ilam, M’gēfesa kwa ha nye ifufe nile ndia; ọ gaghi-adi kwa mba ọ bula ebe ndi Ilam achugara achuga nāgaghi-abà.

37 M’gēme kwa ka Ilam tua ujọ n’iru ndi-iro-ha na n’iru ndi nāchọ ndu-ha: M’gēme kwa ka ihe ọjọ biakwasi ha, bú iwe di ọku nkem, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); M’gēziga kwa mma-agha n’azu ha, rue mb͕e M’mere ka ha gwusia:

38 M’gēdo kwa oche-eze nkem n’Ilam, M’gēme kwa ka eze na ndi-isi si n’ebe ahu la n’iyì; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

39 Ma o gēru, n’ikpe-azu nke ubọchi nile, na M’gēme ka ndi Ilam adọtara n’agha laghachi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 50

1 Okwu ahu nke Jehova kwuru bayere Babilon, bayere ala ndi Kaldea, site n’aka Jeremaia, bú onye-amuma.

2 Gosinu n’etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ.

3 N’ihi na otù mba esiwo n’Ugwu rigoputa imegide ya, mba ahu gēme ka ala-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ọ dighi kwa onye ganēbi nime ya: ma madu ma anumanu, ha awaghariwo, la.

4 N’ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), umu Israel gābia, ha onwe-ha na umu Juda n’otù; ha ganēje ije nākwa ákwá, ọ bu kwa Jehova, bú Chineke-ha, ka ha gāchọ.

5 Ha gāju ajuju uzọ isi je Zaion, nēche iru-ha n’ebe a, si, Bianu, were onwe-unu rapara n’aru Jehova n’ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nke anāgaghi-echezọ echezọ.

6 Ìgwè ewu na aturu nāla n’iyì ka ndim buworo: ndi-ọzùzù-aturu-ha emewo ka ha kpafue, n’ugwu di iche iche ka ha meworo ka ha laghachi azu: site n’ugwu rue ugwu ntà ka ha jeworo, ha echezọwo ebe-nmakpu-ha.

7 Ndi nile ndi nāchọputa ha eripiawo ha: ndi nākpab͕u ha siri, Ikpe amaghi ayi, n’ihi na ha emehiewo megide Jehova, bú ebe-obibi nke ezi omume, na olile-anya nke ndi bu nna-ha, bú Jehova.

8 Sinu n’etiti Babilon wagharia, si-kwa-nu n’ala ndi Kaldea pua, di-kwa-nu ka nkpi n’iru ìgwè ewu na aturu.

9 N’ihi na, le, Mu onwem gaje ikpọte me ka nkpọkọta mba uku di iche iche si n’ala Ugwu rigoputa imegide Babilon: ha gēdo kwa onwe-ha n’usoro megide ya; agēsi n’ebe ahu were ya: àkú nke usu ahu gādi ka nke dike nke bu ọ̀kà-uta; ọ gaghi-alaghachi azu n’efu.

10 Kaldea gāghọ kwa ihe-nkwata: afọ gēju ndi nile ndi nākwata ya; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

11 N’ihi na unu nāṅuri ọṅu, n’ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n’ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;

12 ihere gēme nne-unu nke-uku; nwanyi nke muru unu gēnwe iru-ihere: le, ọ gābu ọdudù mba nile, na ọzara, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi.

13 Site n’iwe Jehova madu agaghi-ebi nime ya, ma ọ gābusi ebe tọb͕ọrọ n’efu; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n’akuku Babilon anya, ọ gāma ọsọ n’ihi ihe-otiti-ya nile.

14 Donu onwe-unu n’usoro imegide Babilon buruburu, unu ndi nile ndi nāzọ uta ukwu ikwe ya; b͕anu ya, unu asọlara àkú anya: n’ihi na Jehova ka o mehieworo megide.

15 Kpọnu nkpu-agha megide ya buruburu; o kweyewo ekweye; ihe-nkwagide-ya nile adawo, etikpọwo kwa mb͕idi-ya nile: n’ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu: bọ̀nu ya ọ́bọ̀; dika ọ meworo, menu ya otú a.

16 Bipunu ọgha-nkpuru nime Babilon, ya na onye nēji mma-iwe-ihe-ubi na mb͕e owuwe-ihe-ubi: n’iru mma-agha nēme ihe-ike ha gēche iru, onye ọ bula n’ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula n’ala-ya.

17 Aturu nke emeworo ka ọ wagharia ka Israel bu; ọdum di iche iche achupuwo ya: ọdum nke-mbu, bú eze Asiria, ripiara ya; ma ọdum ikpe-azu a, bú Nebukadreza eze Babilon, ab͕ajiwo ọkpukpu-ya nile.

18 N’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M’gaje iji nmehie-ya leta eze Babilon, leta kwa ala-ya, dika M’jiworo nmehie eze Asiria leta ya.

19 M’gēme kwa ka Israel lata n’ebe-ita-nri-ya, ọ gāta kwa nri na Kamel na Beshan, ọ bu kwa n’ugwu Efraim na nime Gilead ka afọ gēju nkpuru-obi-ya.

20 N’ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), agāchọ ajọ omume Israel, ma ọ gaghi-adi; agāchọ kwa nmehie nile nke Juda, ma agaghi-achọta kwa ha: n’ihi na M’gāb͕aghara ndi M’nēme ka ha fọdu nmehie-ha.

21 Rigo megide ala Merataim, imegide ya, rigo kwa rue ndi bi na Pekod: b͕ue, wezuga kwa ka ebibie n’azu ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), me kwa dika ihe nile si di nke M’nyeworo gi n’iwu.

22 Olu agha di n’ala nka, na olu ntipia uku.

23 Le ka esiworo bipu otùtù nke uwa nile, b͕aji kwa ya nke-uku! le ka Babilon siworo ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu nke-uku n’etiti mba nile!

24 Esiworom i ọnyà, ọzọ kwa, amawo gi n’ọnyà ahu, gi Babilon, ma gi onwe-gi amagh: achọtawo gi, ọzọ kwa, ejidewo gi, n’ihi na Jehova ka i lusoworo ọ̀gù.

25 Jehova emeghewo ulo-àkù-Ya, chiputa ihe-agha nile nke oké iwe-Ya: n’ihi na ozi di nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēje n’ala ndi Kaldea.

26 Sinu na nsọtu-ya biarue ya, meghenu ọba-ya nile: tulienu ya dika obo-ihe, wezuga-kwa-nu ya ka ebibie ya: ekwela ka ihe fọduru ya.

27 Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n’ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha.

28 Ge nti olu ndi nāb͕alaga, ndi nāb͕apu n’ala Babilon, igosi ibọ̀-ọ́bọ̀ nke Jehova, bú Chineke-ayi, na Zaion, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.

29 Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n’ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel.

30 N’ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n’amá-ya nile, agēme kwa ka ndi-agha-ya nile dere du n’ubọchi ahu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

31 Le, Mu nēmegide gi, gi onye-nganga, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta): n’ihi na ubọchi-gi abiawo, bú mb͕e M’gēleta gi.

32 Onye-nganga gāsu kwa ngọngọ, da, ma ọ dighi onye ganēme ka o bilie: M’gēsuye kwa ọku n’obodo ya nile, o gēripia kwa ebe nile di ya buruburu.

33 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ndi emeb͕uru emeb͕u ka umu Israel na umu Juda bu n’otù: ndi nile dọtaworo ha n’agha ejidesiwo ha ike; ha ajuwo izilaga ha.

34 Onye-nb͕aputa-ha di ike; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: Ọ gēkpezu ọnu-ha, ka O we me ka uwa doro aru ala, me kwa ka ndi bi na Babilon me nkpatu.

35 Mma-agha di n’aru ndi Kaldea, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na n’ebe ndi bi na Babilon nọ, na n’ebe ndi-isi-ya nọ, na n’ebe ndi-ya mara ihe nọ.

36 Mma-agha di n’ebe ndi-ekwukwu nọ, ha gāghọ ndi b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ha: mma-agha di n’ebe ndi-dike-ya nọ, ha gātu kwa ujọ.

37 Mma-agha di n’ebe inyinya-ya nile di, na n’ebe ub͕ọ-ala-ya di, na n’ebe ndi nile gwara ọgwa nọ, bú ndi nọ n’etiti ya, ha gāghọ kwa ndinyom: mma-agha di n’ebe àkù-ya nile di, agāluta kwa ha n’agha.

38 Ọkpukpọ-nku di n’ebe miri-ya nile di, ha gāta kwa ata: n’ihi na ala arusi di iche iche apiri api ka ọ bu, ha ji kwa ihe-egwu nile ha wi ara.

39 N’ihi nka ka anu-ọhia di iche iche nke bi n’ala kpọrọ nku gēbi n’ebe ahu, ha na anu-ọhia nke nēbe ebe, enyi-nnunu gēbi kwa n’ebe ahu: madu agaghi-ebi kwa nime ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ gaghi-abu kwa ebe-obibi rue ọb͕ọ nile.

40 Dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); otú a ọ dighi onye ọ bula gēbi n’ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.

41 Le, otù ndi nēsi n’Ugwu bia; ọzọ, mba uku na ọtutu ndi-eze ka agākpọte site na nsọtu nile nke uwa.

42 Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ha bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕ọ dika oké osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n’usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Babilon.

43 Eze Babilon anuwo ùdé-ha, aka-ya abua we kuda: ihe-nb͕u ejidewo ya, ihe-nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme.

44 Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebe-ita-nri nādigide mb͕e nile: ma n’otù ntabi-anya ka M’gēme ka ha si n’aru ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara? onye-nlekọta-ya ka M’gēme ya: n’ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n’irum?

45 N’ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Babilon; na èchìchè-Ya nile nke O chèworo megide ala ndi Kaldea, si: N’ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu: n’ezie ọ gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha.

46 Site n’olu nke owuwe Babilon uwa mara jijiji, anuwo kwa iti-nkpu n’etiti mba nile.