Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 31

1 Na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gāburu ab͕uru nile nke Israel Chineke, ndi ahu gābu-kwa-ram otù ndi.

2 Otú a ka Jehova siri, Ndi siri na mma-agha fọdu hutara amara n’ọzara; mb͕e M’jere ime ka o nwe ọnọdu, bú Israel.

3 Site n’ebe di anya ka Jehova mere ka m’hu Ya, si, Ọ bu ihu-n’anya nke di mb͕e ebighi-ebi ka M’jiworo hu gi n’anya: n’ihi nka ka M’meworo ka ebere digidere gi.

4 M’gēwu kwa gi ọzọ dika ulo, ewe wu gi, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú Israel: agēji kwa egwú-otiti-gi nile chọ gi nma ọzọ, i gēso kwa otite-egwú nke ndi nēgwuri egwú pua.

5 I gāku kwa ubi-vine ọzọ n’elu ugwu nile nke Sameria: ndi nāku vine gāku, me ka ha pua na nsọ anāsọ ha.

6 N’ihi na otù ubọchi gādi mb͕e ndi-nche ndi nọ n’ugwu Efraim gākpọ, si, Bilienu, ka ayi rigorue Zaion jekuru Jehova, bú Chineke-ayi.

7 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Werenu ọṅù tiere Jekob nkpu ọṅù, tisi-kwa-nu nkpu ike n’isi mba nile: menu ka anuru ya, tonu, si-kwa-nu, Jehova, zọputa ndi-Gi, bú Israel fọduru.

8 Le, M’gaje ime ka ha si n’ala Ugwu bia, M’gāchikọputa kwa ha na nsọtu nile nke uwa, n’etiti ha ka onye-ìsì na onye-ngwurọ na nwanyi di ime na nwanyi ime nēme gānọ n’otù: na nkpọkọta uku ka ha gālata n’ebe a.

9 N’ikwa-ákwá ka ha gābia, ọ bu kwa n’aririọ-amara nile ka M’gēduru ha: M’gēme ka ha jerue iyi di iche iche juputara na miri, n’uzọ ziri ezi, nke ha nāgaghi-asu ngọngọ nime ya: n’ihi na aghọworom Israel nna, ma Efraim, ọkparam ka ọ bu.

10 Nurunu okwu Jehova, unu mba nile, gosi-kwa-nu ya n’agwe-etiti nile di n’ebe di anya; si-kwa-nu, Onye nēfesa Israel gāchikọta ya, debe kwa ya, dika onye-ọzùzù-aturu si emere ìgwè aturu-ya.

11 N’ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, me ka ọ pua n’aka onye dikariri ya ike nwere onwe-ya.

12 Ha gābia kwa, tie nkpu ọṅù n’ebe di elu nke Zaion, rùba dika osimiri rue ezi ihe Jehova, rue ọka, ru kwa manya-vine, ru kwa manu, ru kwa umu ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi: nkpuru-obi-ha gādi kwa ka ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma; ha agaghi-eru kwa újú ọzọ ma-ọli.

13 Mb͕e ahu ka nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke gāṅuri ọṅu n’otite-egwú, umu-okorọbia na ndi-okenye gāṅuri kwa ọṅu n’otù: n’ihi na M’gāb͕anwe oruru-újú-ha n’obi-utọ, kasi kwa ha obi, me ka ha si na nwuta-ha ṅuria ọṅu.

14 M’gēme kwa ka afọ abuba jubiga nkpuru-obi ndi-nchu-àjà ókè, afọ ezi ihem gēju kwa ndim; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

15 Otú a ka Jehova siri: Olu nime Rema ka anuru, bú abù-ákwá, na ikwa-ákwá nēlu ilu nke-uku, Rechel nākwara umu-ya ákwá; ọ juwo na agaghi-akasi ya obi bayere umu-ya, n’ihi na ha adighi.

16 Otú a ka Jehova siri: Jide olu-gi ka ọ ghara ikwa ákwá, jide kwa anya-gi abua ka ha ghara ib͕a anya-miri: n’ihi na ugwọ-ọlu di agākwu gi n’ọlu-gi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): ha gēsi kwa n’ala onye-iro lata.

17 Olile-anya di-kwa-ra ọdi-n’iru-gi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); umu-gi gālata kwa n’ókè-ala-ha.

18 Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n’aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m’we chigharia onwem; n’ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem.

19 N’ezie mb͕e m’chigharisiri, m’we chegharia: ọzọ, mb͕e emesiri ka m’mara, m’we tie aka n’apata-ukwum; ihere merem, ewe tiyekwam n’ọnọdu-ihere, n’ihi na eburum ita-uta nke mb͕e m’di na nwata.

20 Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M’nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n’ihi na ka mb͕e ra M’nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n’ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n’aru ya ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

21 Me ka ogidi di iche iche iri uzọ ama guzoro onwe-gi ọtọ, doro onwe-gi ide di iche iche iri uzọ ama: tukwasi obi-gi n’uzọ ahu atuliri atuli, bú uzọ nke i jere ije nime ya: lata, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú israel, lata n’obodo-gi ndia.

22 Rùe ole mb͕e ka i ganēje iru na azu, gi ada nke nādaghachi azu? n’ihi na Jehova ekèwo ihe -ohu n’uwa, Nwanyi gānọ nwoke buruburu.

23 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ha gēkwu kwa okwu a ọzọ n’ala Juda, na n’obodo-ya nile, mb͕e m’gēme ka ndi-ya adọtara n.agha lata, si: Jehova gọzie gi, gi ebe-obibi nke ezi omume, gi ugwu nke idi-nsọ.

24 Juda na obodo-ya nile gēbikọ nime ya n’otù; ndi-ubi, na ndi nāchiri ìgwè aturu-ha bulie ije.

25 N’ihi na emewom ka afọ jubiga nkpuru-obi nāda #mbà ókè, ọ bu kwa nkpuru-obi ọ bula nke nēru újú ka M’juworo.

26 Mb͕e nka gasiri m’we teta, we hu; uram we tọm utọ.

27 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gagha nkpuru madu na nkpuru anumanu n’ulo Israel na n’ulo Juda.

28 Ọ gēru kwa na, dika M’muworo anya n’aru ha iropu na ikwada, na itikpọ na ime ka ala n’iyì, na imejọ; otú a ka M’gāmu anya n’aru ha iwu ulo na iku ihe n’ubi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

29 N’ubọchi ahu ha agaghi-asi kwa ọzọ, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì.

30 Kama onye ọ bula gānwu n’ihi ajọ omume nke aka ya: madu ọ bula nke nēri nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé-ya ganēru izìzì.

31 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu:

32 ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara n’ubọchi M’jidere ha n’aka ime ka ha si n’ala Ijipt puta; n’ihi na ha onwe-ha mebiri ọb͕ub͕a-ndum ahu, ọ bu ezie na Mu onwem bu di nwe ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

33 N’ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); M’gētiye iwum n’ime-ha, ọ bu kwa n’obi-ha ka M’gēdekwasi ya dika n’akwukwọ; M’gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:

34 ha agaghi-eme kwa onwe-ha ka ha muta ọzọ, onye ọ bula o me ka onye-ab͕ata-obi-ya muta, onye ọ bula o me kwa ka nwa-nne-ya muta, si, Maranu Jehova: n’ihi na ha nile gāmara Mu onwem, site n’onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): n’ihi na M’gāb͕aghara ajọ omume-ha, M’gaghi-echeta kwa nmehie-ha ọzọ.

35 Otú a ka Jehova siri, bú Onye nēnye anyanwu ka ọ buru ìhè n’ehihie, na ukpuru nile nke ọnwa na nke kpakpando nile ka ha buru ìhè n’abali, Onye nēme ka oké osimiri dere du mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:

36 Ọ buru na ukpuru ndia apua n’irum, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), nkpuru Israel gākwusi kwa n’ibu mba n’irum ubọchi nile.

37 Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na agātù elu-igwe nke di n’elu, ọ buru kwa na egwuputa ntọ-ala nile nke uwa nke di n’okpuru, Mu onwem gāju kwa nkpuru nile nke Israel n’ihi ihe nile nke ha meworo; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

38 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e agēwuru Jehova obodo a site n’ulo-elu nke Hananel rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku.

39 Eriri ọtùtù gāpu kwa ọzọ na ncherita-iru ya, rue ugwu ntà Gareb, ọ gāga kwa buruburu rue Goa.

40 Ndagwurugwu ahu nile nke ozu, na nke ntu, na ọzara nile rue miri-iyi Kidron, rue nkuku ọnu-uzọ-ama inyinya n’akuku ọwuwa-anyanwu, gābu ihe nsọ Jehova nwere; agaghi-eropu ya, agaghi-etikpọ kwa ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 32

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova n’arọ nke-iri nke Zedekaia, bú eze Juda, nke bu arọ nke-iri-na-asatọ nke Nbukadreza.

2 Ma mb͕e ahu usu-ndi-agha eze Babilon nānọchigide Jerusalem n’agha: ma Jeremaia, bú onye-amuma, nọ ka onye eb͕ochibidoworo n’ogige ulo-nche, nke di n’ulo eze Juda.

3 N’ihi na Zedekaia, bú eze Juda, b͕ochibidoro ya-ri, si, Gini mere gi onwe-gi ji ebu amuma, si, Otú a ka Jehova siri, Le, M’gaje inye obodo a n’aka eze Babilon, ọ gēwere kwa ya;

4 ma Zedekaia, bú eze Juda, agaghi-ewepuga onwe-ya n’aka ndi Kaldea, kama aghaghi inye ya n’aka eze Babilon, ha gēkwurita kwa ọnu na ọnu, anya-ya gāhu kwa anya-ya:

5 ọ bu kwa Babilon ka ọ gēme ka Zedekaia jerue, ọ bu kwa n’ebe ahu ka ọ gānọ rue mb͕e M’gēleta ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): mb͕e unu gēbuso ndi Kaldea agha, ọ gaghi-agara unu nke-ọma?

6 Jeremaia we si, Okwu Jehova rurum nti, si,

7 Le, Hanamel nwa Shalum, bú nwa-nne nna-gi, gābiakute gi, si, Zutara onwe-gi ubim nke di n’Anatot: n’ihi na gi ka nb͕aputa ruru izuru ya.

8 Hanamel nwa nwa-nne nnam we biakutem, dika okwu Jehova si di, rue ogige ulo-nche, sim, Biko, zuru ubim nke di n’Anatot, nke di n’ala Benjamin: n’ihi na gi ka nnweta-ya ruru, ọ bu kwa gi nwe nb͕aputa-ya; zutara onwe-gi. M’we mara na okwu Jehova ka nka bu.

9 M’we zuru ubi ahu n’aka Hanamel nwa nwa-nne nnam, bú nke di n’Anatot, m’we tùara ya ego-ya, bú shekel iri na asa nke ọla-ọcha.

10 M’we de aham n’akwukwọ ala ahu, ka ya akàrà, kpọ ndi-àmà, tùara ya ego ahu n’ihe-ọtùtù.

11 M’we were akwukwọ nzuta-ala ahu, ma nke akara akàrà, nke ihe-ya enyere n’iwu na ukpuru-ya nile di nime ya, ma nke ghere oghe:

12 m’we were akwukwọ nzuta-ala ahu nye Beruk nwa Neraia, nwa Mahseia, n’anya Hanamel nwa nwa-nne nnam, na n’anya ndi-àmà ndi deworo aha-ha n’akwukwọ nzuta-ala ahu, n’anya ndi-Ju nile ndi nānọdu ala n’ogige ulo-nche ahu.

13 M’we nye Beruk iwu n’anya ha, si,

14 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Chiri akwukwọ ndia, bú akwukwọ nzuta-ala nka, ma nke akara akàrà, ma akwukwọ a nke ghere oghe, tiye ha n’ite urọ; ka ha we digide ọtutu ubọchi.

15 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Agāzu kwa ulo na ubi na ubi-vine ọzọ n’ala nka.

16 M’we kpere Jehova ekpere, mb͕e m’nyesiri Beruk nwa Neraia akwukwọ nzuta-ala, ahu, si,

17 Ewo, Onye-nwe-ayi Jehova! le, Gi onwe-gi emewo elu-igwe na uwa site n’ike uku Gi na site n’ogwe-aka-Gi eseteri eseti: ọ dighi ihe ọ bula kariri Gi ime:

18 Gi onye nēmere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nākwughachi ajọ omume nke ndi bu nna n’obi umu-ha gēsota ha n’azu: Chineke uku, nke bu dike, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:

19 I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n’omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di:

20 Onye doro ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n’ala Ijipt, rue ta, ma n’etiti Israel ma n’etiti madu ọzọ; I we mere Onwe-gi aha, dika ta;

21 I we ji ihe-iriba-ama di iche iche, ji kwa ihe-ebude di iche iche, ji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka setiri eseti, ji kwa egwu di uku, me ka ndi-Gi, bú Israel, si n’ala Ijipt puta;

22 I we nye ha ala nka, nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya;

23 ha we bata, nweta ya; ma ha egeghi nti olu-Gi, ọ bu kwa n’iwu-Gi ka ha nējegharighi; n’ihe nile nke I nyere ha n’iwu ime ọ dighi nke ha meworo: I we me ka ihe ọjọ a nile dakwasi ha:

24 Le, obo-ihe ndia atuliri atuli, ha abiaruwo obodo a iwere ya; enyewo kwa obodo a n’aka ndi Kaldea ndi nēbuso ya agha, n’ihi mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe: ihe I kwuworo erèwo kwa; ma, le, I nāhu ya.

25 Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, asiwom, Were ego zutara onwe-gi ubi ahu, kpọ kwa ndi-àmà; ma enyewo obodo a n’aka ndi Kaldea.

26 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

27 Le, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke anu-aru nile, bú madu: ọ̀ di ihe ọ bula karirim ime?

28 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M’gaje inye obodo a n’aka ndi Kaldea, na n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon, ọ gēwere kwa ya:

29 ndi Kaldea, bú ndi nēbuso obodo a agha, gābia kwa suye obodo a ọku, sure ya na ulo nile, nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye Beal n’elu-ha, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe.

30 N’ihi na umu Israel na umu Juda aghọwo nání ndi nēme ihe jọrọ njọ n’anyam abua site na mb͕e ha di na nwata: n’ihi na umu Israel bu nání ndi ji ọlu aka-ha akpasum iwe; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

31 N’ihi na ihe ikpasu iwem na ikpasu ọnumam ka obodo a buruworom site n’ubọchi mb͕e ha wuru ya we rue ta; ka M’we si n’irum wezuga ya:

32 n’ihi ihe ọjọ ahu nile nke umu Israel na nke umu Juda, nke ha meworo ikpasum iwe, ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-àjà-ha, na ndi-amuma-ha, na ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem.

33 Ha we b͕akutam azu, ha echeghm iru: anameme kwa ka ha muta ihe, nēbili n’isi-ututu nēme ka ha muta, ma ha adighi-anu inara idọ́-aka-na-nti.

34 Ha we do ihe-árú nile ha n’ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.

35 Ha we wue ebe nile di elu nke Beal, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, ime ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom si n’ọku gabigarue Molek; bú ihe nke M’nēnyeghi ha n’iwu, ọ bataghi kwa n’obim, ka ha we me ihe-árú a; ime ka Juda mehie.

36 Ma ub͕u a n’ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a bayere obodo a, nke unu onwe-unu nāsi, Enyewo ya n’aka eze Babilon site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe:

37 si, Le, M’gaje ichikọputa ha n’ala nile, ebe M’chugaworo ha n’iwem, na n’ọnumam, na n’oké iwe di uku; M’gēme kwa ka ha lata n’ebe a, me kwa ka ha biri na ntukwasi-obi:

38 ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke:

39 M’gēnye kwa ha otù obi na otù uzọ, itu egwu Mu onwem ubọchi nile; ka o we diri ha, di-kwa-ra umu-ha ndi gānọchi ha, nma:

40 Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M’gaghi-esi n’iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M’gētiye n’obi-ha, ka ha we ghara isi n’ebe M’nọ wezuga onwe-ha.

41 Obi gātọkwam utọ n’aru ha ime ha nma, M’gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n’ala nka n’ezie dika osisi.

42 N’ihi na otú a ka Jehova siri: Dika M’meworo ka ihe ọjọ uku a nile biakute ndi nka, otú a ka Mu onwem nēme ka ezi ihe ahu nile biakwasi ha, bú nke Mu onwem nēkwu bayere ha.

43 Agāzú kwa ọhia n’ala nka, nke unu onwe-unu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu bi nime ya; enyewo ya n’aka ndi Kaldea.

44 Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n’akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n’ala Benjamin, na n’ebe nile di Jerusalem buruburu, na n’obodo nile nke Juda, na n’obodo nile nke ugwu, na n’obodo nile nke ebe di ala ala, na n’obodo nile nke Negeb: n’ihi na M’gēme ka ndi-ha adọtara n’agha lata; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 33

1 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti nke ub͕ò abua, mb͕e ya onwe-ya nọ ka onye eb͕ochibidoworo n’ogige ulo-nche, si,

2 Otú a ka Jehova, bú Onye nēme ya, Jehova, bú Onye nākpu ya ime ka o guzosie ike, Onye Jehova bu aha-Ya, siri:

3 Kpọkuem, na M’gāza gi, gosi kwa gi ihe uku di iche iche, nke di kwa ike ighọta, nke i nāmaghi.

4 N’ihi na okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere ulo nile nke obodo a, baye-kwa-ra ulo nile nke ndi-eze Juda, nke akwadaworo imegide obo-ihe nile atuliri atuli na imegide mma-agha, si:

5 Ha nābia ibuso ndi Kaldea agha, na imeju ha n’ozu madu ndi M’tib͕uworo n’iwem na n’ọnumam, ndi M’zonariwo-kwa-ra obodo a irum n’ihi ihe ọjọ nile ha.

6 Le, M’gaje ime ka anu-aru ọhu puchie n’aru ya, ya na ngwọta, M’gāgwọta kwa ha; M’gēkpughe-kwa-ra ha nbabiga-ókè nke udo na ezi-okwu.

7 M’gēme kwa ka ndi Juda adọtara n’agha na ndi Israel adọtara n’agha lata, M’gēwu kwa ha dika ulo, dika na mbu.

8 M’gēme kwa ka ha si n’ajọ omume nile ha, bú nke ha mehieworo megidem, di ọcha; M’gāb͕aghara kwa ha ajọ omume-ha nile nke ha mehieworo megidem, na nke ha jehieworo megidem n’ime ha.

9 Obodo a gāghọ-kwa-ram aha obi-utọ, na otuto, na ima-nma, diri mba nile nke uwa, ndi gānu ezi ihe ahu nile nke Mu onwem nēmere ha, ndi gātu kwa oké egwu ma jijiji n’ihi ezi ihe ahu nile na n’ihi udo ahu nile nke Mu onwem nēmere ya.

10 Otú a ka Jehova siri: Agānu kwa ọzọ n’ebe a, nke unu onwe-ūnu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, ọbuná n’obodo nile nke Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem, nke bu ebe tọb͕ọrọ n’efu, nke ọ n’adighi madu, ọ nādighi kwa onye-obibi, ọ nādighi kwa anumanu, nēbi nime ha,

11 agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n’ihi na Jehova di nma, n’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n’ulo Jehova. N’ihi na M’gēme ka ndi ala nka adọtara n’agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

12 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: N’ebe a, nke bu nkpọnkpọ ebe, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, na n’obodo-ya nile, ka ebe-obibi nke ndi-ọzùzù-aturu ndi nēme ka ìgwè ewu na aturu-ha makpu gādi kwa ọzọ.

13 N’obodo nile nke ugwu, na n’obodo nile nke ebe di ala ala, na n’obodo nile nke Negeb, na n’ala Benjamin, na n’ebe nile nke di Jerusalem buruburu, na n’obodo nile nke Juda, ka ìgwè ewu na aturu gāgabiga kwa ọzọ n’okpuru aka abua nke onye nāgu ha ọnu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

14 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gēme ka ezi okwu ahu guzosie ike, bú nke M’gwaworo ulo Israel, nke M’kwuwo-kwa-ra bayere ulo Juda.

15 N’ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, ka M’gēme ka Ihe-opupú nke ezi omume puere Devid; ọ gēme kwa ihe ekpere n’ikpe na ezi omume n’ala nka.

16 N’ubọchi ahu ka agāzọputa Juda, Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha nke agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi.

17 N’ihi na otú a ka Jehova siri: Agaghi-ebipu n’ulo Devid onye nwe inọkwasi n’oche-eze ulo Israel;

18 ọzọ, agaghi-ebipu n’ulo ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, n’irum onye nwe isure àjà-nsure-ọku, na isure onyinye-inata-iru-ọma dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì, utọ, na ichu àjà ubọchi nile.

19 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

20 Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu gēmebi ọb͕ub͕a-ndum nke ehihie, na ọb͕ub͕a-ndum nke abali, ka ehihie na abali we ghara id i na mb͕e-ha;

21 ya bu na agēmebi ọb͕ub͕a-ndum, nke Mu na Devid, bú orùm, b͕ara, ka o we ghara inwe nwa-nwoke nke bu eze n’elu oche-eze-ya; na ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi Livai, bú ndi-nchu-àjà, ndi nējerem ozi, b͕ara.

22 Otú agaghi-agu usu ihe di n’elu-igwe ọnu, na otú agaghi-atùta ájá nke oké osimiri; otú a ka M’gēme ka nkpuru Devid, bú orùm, na ndi Livai ndi nējerem ozi, ba uba.

23 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

24 Ì hughi ihe ndi nka kwuworo, si, Ab͕uru abua nke Jehova rọputara, Ọ juworo ha? ọ bu kwa ndim ka ha nēlelì anya, ha we ghara ibu kwa mba n’iru ha ọzọ.

25 Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na ọb͕ub͕a-ndum nke ehihie na abali adighi, ọ buru na atọghm ukpuru nile nke elu-igwe na uwa;

26 ya bu na M’gāju nkpuru Jekob, na Devid, bú orùm, M’we ghara isi na nkpuru-ya were ndi ganāchi nkpuru nke Abraham na Aisak na Jekob: n’ihi na M’gēme ka ndi-ha adọtara n’agha lata, M’gēnwe kwa obi-ebere n’aru ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 34

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebukadneza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, na ala-eze nile nke uwa nke aka-ya nāchi, na ndi nile di iche iche, nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo-ya nile, agha, si:

2 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Je, gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu, si ya, Otú a ka Jehova siri, Le, M’gaje inye obodo a n’aka eze Babilon, ọ gēsure kwa ya n’ọku:

3 ma gi onwe-gi aghaghi-iwepuga onwe-gi n’aka-ya, kama aghaghi iwere gi, ọ bu kwa n’aka-ya ka agēnye gi; anya-gi abua gāhu kwa anya abua nke eze Babilon, unu gēkwurita kwa ọnu na ọnu, ọ bu kwa Babilon ka i gābà.

4 Ma otú ọ di, nuru okwu Jehova, gi Zedekaia, bú eze Juda: okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere gi, si, I gaghi-anwu site na mma-agha:

5 n’udo ka i gānwu; ọzọ, nsure nile nke nna-gi-hà, bú ndi-eze mbu, ndi buru gi uzọ, otú a ka ha gēsurere gi ihe; ọzọ, Éwù, onye-nwe-ayi! ka ha gāsi n’itiri gi aka n’obi; n’ihi na okwu ka Mu onwem kwuworo; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

6 Jeremaia, bú onye-amuma, we gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu ndia nile nime Jerusalem,

7 mb͕e usu-ndi-agha nke eze Babilon nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo Juda nile fọduru, agha, bú Lekish na Azeka; n’ihi na nání ndia fọduru nime obodo nile nke Juda, bú obodo ewusiri ike.

8 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Zedekaia, bú eze, na ndi Israel nile ndi nọ Jerusalem, b͕asiri ndu, ikpọsara ha si na ha nwere onwe-ha;

9 na ha nile gēzilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, nke bu nwoke Hibru ma-ọbu nwanyi Hibru, inwere onwe-ya; ka madu we ghara ime ka ha fè ya òfùfè-orù, onye ọ bula o me ka onye-Ju, bú nwa-nne-ya, fè ya:

10 ndi-isi nile na ndi Israel nile we nuru, bú ndi bàra n’ọb͕ub͕a-ndu ahu, izilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, inwere onwe-ha, ka madu ọ bula we ghara ime kwa ka ha fè ya òfùfè-orù ọzọ; ha we nuru, zilaga ha:

11 ma emesia ha chighariri, me ka ndi-orù-ha ndikom na ndinyom ndi nējere ha ozi, bú ndi ha zilagarari inwere onwe-ha, lata, ha we buda ha ka ha buru orù-ndikom na ndinyom nējere ha ozi:

12 okwu Jehova we rue Jeremaia nti site na Jehova, si,

13 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Mu onwem na nna-unu-ha b͕ara ndu n’ubọchi M’mere ka ha si n’ala Ijipt, n’ulo ndi-orù, puta, si,

14 N’ọgwugwu arọ asa unu gēzilaga, onye ọ bula nwa-nne-ya, bú onye-Hibru, nke rere onwe-ya n’aka-gi, we fè gi arọ isi, i gēzilaga ya inwere onwe-ya: ma nna-unu-hà egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n’ala.

15 Unu onwe-unu we chigharia ta, we me ihe ziri ezi n’anyam abua, n’ikpọsa, onye ọ bula ọ gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya pua n’aka-gi; unu we b͕a ndu n’irum n’ulo nke akpọkwasiri aham:

16 unu we chigharia me ka aham ghara idi nsọ, me, onye ọ bula o me orù-ya nwoke, onye ọ bula o me nwanyi nke nējere ya ozi, ka ha lata, bú ndi unu zilagarari inwere onwe-ha n’ọchichọ nkpuru-obi-ha; unu we buda ha iburu unu orù-ndikom na ndinyom nējere unu ozi.

17 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a: Unu onwe-unu egeghm nti, ikpọsa, onye o bula ọ gwa nwa-nne-ya, onye ọ bula o gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya: le, M’nākpọsara unu si na unu nwere onwe-unu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ibà na mma-agha, na ibà n’ajọ ọria nēfe efe, na ibà n’oké unwu; M’gēwere kwa unu nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.

18 M’gēwere kwa ndikom ndi nējehie n’ọb͕ub͕a-ndum nye, bú ndi nēmeghi ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke ha b͕ara n’irum guzosie ike, bú nwa-ehi nke ha kpọwara abua, we gabiga n’etiti nkpọwa-ya abua;

19 bú ndi-isi Juda, na ndi-isi Jerusalem, na ndi-onozi, na ndi-nchu-àjà, na ndi nile nke ala nka, ndi gabigaworo n’etiti nkpọwa abua nke nwa-ehi ahu;

20 M’gēwere ha nye n’aka ndi-iro-ha, na n’aka ndi nāchọ ndu-ha: ozu-ha ewe ghọrọ anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anu-ọhia nke uwa, ihe-oriri.

21 Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya ka M’gēnye n’aka ndi-iro-ha, na n’aka ndi nāchọ ndu-ha, na n’aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ndi nēsi n’ebe unu nọ rigo la.

22 Le, M’gaje inye iwu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), me ka ha biaghachi n’obodo a; ha gēbuso kwa ya agha, were ya, sure ya n’ọku: ọ bu kwa obodo nile nke Juda ka M’gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ghara inwe onye-obibi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 35

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site Jehova n’ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si,

2 Je n’ulo ndi Rikab, gwa ha okwu, me ka ha bata n’ulo Jehova, n’otù n’ime-ulo-ya, me ka ha ṅua manya-vine.

3 M’we kuru Jeazanaia nwa Jeremaia, nwa Habazinaia, na umu-nne-ya, na umu-ya ndikom nile, na ulo nile nke ndi Rikab;

4 m’we me ka ha bata n’ulo Jehova, n’ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n’akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n’elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ:

5 M’we che n’iru umu ulo ndi Rikab ọkwa ufọdu juputara na manya-vine na iko ufọdu, m’we si ha, Ṅuanu manya-vine.

6 Ha we si, Ayi agaghi-aṅu manya-vine: n’ihi na Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, nyere ayi iwu, si, Unu aṅula manya-vine, unu onwe-unu, na umu-unu, rue mb͕e ebighi-ebi:

7 unu ewu-kwa-la ulo, unu agha-kwa-la nkpuru, unu aku-kwa-la ubi-vine, unu enwe-kwa-la ihe ndia: kama ọ bu n’ulo-ikwū ka unu gēbi ubọchi nile nke unu; ka unu we di ndu ọtutu ubọchi n’elu ala ahu ebe unu onwe-unu bu ndi-ọbìa.

8 Ayi we ge nti olu Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, n’ihe nile nke o nyere ayi n’iwu, ighara iṅu manya-vine ubọchi nile ayi, ayi onwe-ayi, na ndinyom-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom;

9 na ighara iwu ulo ka ayi we biri nime ha: ọ dighi kwa ubi-vine, ma-ọbu ubi, ma-ọbu nkpuru-ọghigha ayi nwere:

10 ayi we biri n’ulo-ikwū, we ge nti, me dika ihe nile si di nke Jonadab, bú nna-ayi, nyere ayi n’iwu.

11 O rue, mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, rigotara n’ala nka, na ayi siri, Bianu, ka ayi ba na Jerusalem n’ihi usu-ndi-agha nke ndi Kaldea, na n’ihi usu-ndi-agha nke Siria; ayi we biri na Jerusalem.

12 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

13 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Je, si ndi Juda, si kwa ndi bi na Jerusalem, Ùnu agaghi-anara idọ-aka-na-nti ige nti okwum nile? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

14 Emewo ka okwu nile nke Jonadab nwa Rikab guzosie ike, bú nke o nyere umu-ya n’iwu, ka ha ghara iṅu manya-vine, ha aṅughi kwa manya-vine rue ta, n’ihi na ha anuwo ihe nke nna-ha nyere n’iwu: ma Mu onwem agwawo unu okwu, nēbili n’isi-ututu nēkwu; ma unu egeghm nti.

15 M’we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n’isi-ututu nēzite ha, si, Biko, sinu, onye ọ bula n’uzọ ọjọ ya, lata, me-kwa-nu ka omume nile unu di nma, unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha, biri-kwa-nu n’ala nka nke M’nyere unu, nye kwa nna-unu-hà: ma unu atọghi nti-unu n’ala, unu egeghkwam nti.

16 N’ihi na umu Jonadab nwa Rikab emewo ka ihe ahu nna-ha nyere n’iwu guzosie ike, bú nke o nyere ha n’iwu, ma ndi nka egeghm nti;

17 n’ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M’gaje ime ka ihe ọjọ ahu nile biakute Juda, biakute kwa ndi nile bi na Jerusalem, bú nke M’kwuworo megide ha: n’ihi na agwawom ha okwu, ma ha anughi; M’we kpọ ha òkù, ma ha azaghi.

18 Jeremaia we si ulo ndi Rikab, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N’ihi na unu egewo nti ihe Jonadab, bú nna-unu, nyere n’iwu, unu we debe ihe nile o nyere n’iwu, unu we me dika ihe nile si di nke o nyere unu n’iwu;

19 n’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Agaghi-ebipu n’ulo Jonadab nwa Rikab onye nwe iguzo n’irum ubọchi nile.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 36

1 O rue, n’arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, na okwu a ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2 Were n’onwe-gi akwukwọ-npiakọta, de nime ya okwu nile nke M’gwaworo gi imegide Israel, na imegide Juda, na imegide mba nile, site n’ubọchi M’gwara gi okwu, site n’ubọchi Josaia, we rue ta.

3 Eleghi anya ulo Juda gānu ihe ọjọ ahu nile nke Mu onwem nēchè ime ha; ka ha we lata, onye o bula o si n’uzọ ọjọ ya lata; ka M’we b͕aghara ajọ omume-ha na nmehie-ha.

4 Jeremaia we kpọ Beruk nwa Neraia; Beruk we dere n’ọnu Jeremaia okwu nile nke Jehova, nke Ọ gwara ya-ri, n’akwukwọ-npiakọta.

5 Jeremaia we nye Beruk iwu, si, Mu onwem bu onye eb͕ochibidoworo; apughm ibà n’ulo Jehova:

6 ma gi onwe-gi je, gua n’akwukwọ-npiakọta ahu, nke i deworo site n’ọnum, okwu nile nke Jehova na nti ndi Israel, n’ulo Jehova n’ubọchi obubu-ọnu: ọ bu kwa na nti Juda nile ndi si n’obodo nile ha abia ka i gāgu ha.

7 Eleghi anya aririọ-amara-ha gāda n’iru Jehova, ha ewe lata, onye ọ bula o si n’uzọ ọjọ ya lata: n’ihi na ọ di uku, bú iwe ahu na ọnuma ahu nke Jehova kwuworo megide ndi nka.

8 Beruk nwa Neraia we me dika ihe nile si di nke Jeremaia, bú onye-amuma, nyere ya n’iwu, o we gua n’akwukwọ ahu okwu nile nke Jehova n’ulo Jehova.

9 O rue, n’arọ nke-ise nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, n’ọnwa nke-iteghete, na ndi nile ndi nọ na Jerusalem, na ndi nile ndi si n’obodo nile nke Juda abata na Jerusalem, kpọsara obubu-ọnu n’iru Jehova.

10 Beruk we gua n’akwukwọ ahu okwu nile nke Jeremaia n’ulo Jehova, n’ime-ulo Gemaraia nwa Shefan, bú ode-akwukwọ, n’ogige nke di n’elu, n’oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova, na nti ndi Israel nile.

11 Maikaia nwa Gemaraia, nwa Shefan, we nuru okwu nile nke Jehova nke sitere n’akwukwọ ahu,

12 o we rida n’ulo eze, rue ime-ulo nke ode-akwukwọ: ma, le, n’ebe ahu ka ndi-isi nile nānọdu, bú Elishama ode-akwukwọ, na Delaia nwa Shemaia, na Elnetan nwa Akboa, na Gemaraia nwa Shefan, na Zedekaia nwa Hananaia, na ndi-isi nile.

13 Maikaia we gosi ha okwu nile ọ nuru, mb͕e Beruk nāgu akwukwọ ahu na nti ndi Israel nile.

14 Ndi-isi nile we zìe Jehudi nwa Netanaia, nwa Shelemaia, nwa Kushi, jekuru Beruk, si, Akwukwọ-npiakọta ahu nke iguworo ihe nime ya na nti ndi Israel, were n’aka-gi bia. Beruk nwa Neraia we were akwukwọ-npiakọta ahu n’aka-ya, biakute ha.

15 Ha we si ya, Biko, nọdu ala, gua ya na nti-ayi. Beruk we gua ya na nti-ha.

16 O rue, mb͕e ha nusiri okwu ndia nile, na ha turu oké egwu, onye na ibe-ya, ha we si Beruk, Ayi aghaghi igosi eze okwu ndia nile.

17 Ha we jua Beruk, si, Biko, gosi ayi, Ì siri aṅa deputa okwu ndia nile n’ọnu-ya?

18 Beruk we si ha, N’ọnu-ya ka ọ nākpọrọm okwu ndia nile, ma mu onwem were ink ede ha n’akwukwọ a.

19 Ndi-isi we si Beruk, Je, zobe onwe-gi, gi onwe-gi na Jeremaia; ekwe-kwa-la onye ọ bula mara ebe unu onwe-unu nọ.

20 Ha we bakuru eze n’ogige; ma ha debereri akwukwọ-npiakọta ahu n’ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ; ha we gosi okwu nile na nti abua nke eze.

21 Eze we ziga Jehudi iweta akwukwọ-npiakọta ahu: o we weputa ya n’ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ. Jehudi we gua ya na nti abua nke eze, na na nti ndi-isi nile ndi nēguzo n’akuku eze.

22 Ma eze nānọdu n’ulo mb͕e oyi n’ọnwa nke-iteghete: ọku nēnwu kwa n’ite-ọku nke di n’iru ya.

23 O rue, mb͕e Jehudi gusiri ibe akwukwọ atọ ma-ọbu anọ, na o ji mma ode-akwukwọ bìkasia ya, tubà ya n’ọku nke di n’ite-ọku, rue mb͕e akwukwọ-npiakọta ahu resiri n’ọku nke di n’ite-ọku.

24 Ma ha atughi oké egwu, ha adọwaghi kwa uwe-ha, bú eze na ndi-orù-ya nile ndi nānu okwu ndia nile.

25 Ọzọ kwa, Elnetan na Delaia na Gemaraia riọrọri eze arìriọ ka ọ ghara isure akwukwọ-npiakọta ahu: ma o geghi ha nti.

26 Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.

27 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e eze suresiri akwukwọ-npiakọta ahu, na okwu nile nke Beruk deputara n’ọnu Jeremaia, si,

28 Were kwa n’onwe-gi akwukwọ-npiakọta ọzọ, dekwasi na ya okwu mbu nile nke di n’elu akwukwọ-npiakọta mbu, nke Jehoiakim, bú eze Juda, sureworo ọku.

29 Ma i gēkwu okwu bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si, Otú a ka Jehova siri: Gi onwe-gi esurewo akwukwọ-npiakọta nka ọku, si, Gini mere i ji dekwasi n’akwukwọ a, si, Eze Babilon aghaghi ibia bibie ala nka, me ka madu na anumanu kwusi nime ya?

30 N’ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si: Ọ gaghi-enwe onye ganānọkwasi n’oche-eze Devid: ọzọ, ozu-ya gābu ihe etufuworo nye ọkpukpọ-nku n’ehihie, nye kwa ọtutu-oyi n’abali.

31 M’gēji kwa ajọ omume-ha leta ya, leta kwa nkpuru-ya, leta kwa ndi-orù-ya; M’gēme kwa ka ihe ọjọ ahu nile nke M’gwara ha, ma ha anughi, biakwasi ha, biakwasi kwa ndi bi na Jerusalem, biakwasi kwa ndi Juda.

32 Ma Jeremaia were akwukwọ-npiakọta ọzọ nye Beruk nwa Neraia, bú ode-akwukwọ; o we dere n’ọnu Jeremaia n’elu ya okwu nile nke akwukwọ ahu nke Jehoiakim, bú eze Juda, surereri n’ọku; ọzọ kwa, atukwasiri n’elu ha ọtutu okwu dika ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 37

1 Zedekaia nwa Josaia we ghọ eze n’ọnọdu Konaia nwa Jehoiakim, onye Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka ọ buru eze n’ala Juda.

2 Ma ọ geghi nti, ya onwe-ya, ma ndi-orù-ya, ma ndi ala ahu, n’okwu nile nke Jehova, nke O kwuru site n’aka Jeremaia, bú onye-amuma.

3 Zedekaia, bú eze, we zìe Jehukal nwa Shelemaia, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, jekuru Jereamia, bú onye-amuma, si, Biko, kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere.

4 Ma Jeremaia nābata nāpu kwa n’etiti ndi Israel: n’ihi na ha etiyeghi ya n’ulo-nkpọrọ.

5 Ọzọ, usu-ndi-agha Fero esiwo n’Ijipt puta: ndi Kaldea ndi nānọchigide Jerusalem n’agha we nuru akukọ-ha, ha we si n’imegide Jerusalem rigo.

6 Okwu Jehova we rue Jeremaia, bú onye-amuma, nti, si,

7 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi eze Juda, onye zìworo unu biakutem ijum ase; Le, usu-ndi-agha Fero, nke putaworo iyere unu aka, gālaghachi n’ala-ya, bú Ijipt.

8 Ndi Kaldea gābiaghachi kwa, buso obodo a agha; ha gēwere kwa ya, sure ya n’ọku.

9 Otú a ka Jehova siri: Unu arafula nkpuru-obi-unu, si, Ndi Kaldea aghaghi isi n’imegide ayi la: n’ihi na ha agaghi-ala.

10 N’ihi na ọ buru na unu etib͕usia usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea ndi nēbuso unu agha, nání ndi adupúru adupú ewe fọdu n’etiti ha, ma ha gēbili, onye ọ bula n’ulo-ikwū-ya, we sure obodo a n’ọku.

11 O rue, mb͕e usu-ndi-agha nke ndi Kaldea siri n’imegide Jerusalem rigo n’ihi usu-ndi-agha Fero,

12 na Jeremaia siri na Jerusalem pua ije ala Benjamin, iketa òkè-ya n’ebe ahu, n’etiti ndi Israel.

13 O rue, mb͕e ọ nọ n’ọnu-uzọ-ama Benjamin, na otù onye-nwe nlekọta nọ n’ebe ahu, onye aha-ya bu Iraija nwa Shelemaia, nwa Hananaia; o we jide Jeremaia, bú onye-amuma, si, Ndi Kaldea ka gi onwe-gi nādakuru.

14 Jeremaia we si, Ọ bu okwu-ugha; adighm-adakuru ndi Kaldea; ma o geghi ya nti: Iraija we jide Jeremaia, me ka ọ biakute ndi-isi.

15 Ndi-isi we wesa Jeremaia iwe, tie ya ihe, tiye ya n’ulo-nkpọrọ, bú ulo Jonatan ode-akwukwọ; n’ihi na ulo ahu ka ha mereri ulo-nkpọrọ.

16 Mb͕e Jeremaia batara n’ulo olùlù, na n’ime-ulo ntà ya, Jeremaia we nọdu n’ebe ahu ọtutu ubọchi;

17 eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n’ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N’aka eze Babilon ka agēnye gi.

18 Jeremaia we si eze, bú Zedekaia, Gini ka m’mehieworo megide gi, ma-ọbu megide ndi-orù-gi, ma-ọbu megide ndi nka, na unu tiyeworo mu onwem n’ulo-nkpọrọ?

19 Òle ebe kwa ka ndi-amuma-unu nọ, bú ndi buru unu amuma, si, Eze Babilon agaghi-abia imegide unu, ma-ọbu imegide ala nka?

20 Ma ub͕u a, biko, nuru, onye-nwem, eze: biko, ka aririọ-amaram da n’iru gi; eme-kwa-la ka m’laghachi n’ulo Jonatan, bú ode-akwukwọ, ka m’we ghara inwu n’ebe ahu.

21 Eze, bú Zedekaia, we nye iwu, ha we tiye Jeremaia n’ogige ulo-nche, nēnye ya otù ob͕e achicha kwa-ubọchi site n’èzí ndi-osi-ite, rue mb͕e achicha nile nke di n’obodo gwusiri. Jeremaia we nọgide n’ulo-nche.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 38

1 Shefataia nwa Matan, na Gedalaia nwa Pashua, na Jukal nwa Shelemaia, na Pashua nwa Malkija, we nuru okwu nile nke Jeremaia nāgwa ndi Israel nile, si,

2 Otú a ka Jehova siri, Onye nānọgide n’obodo a gānwu site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpukuru ndi Kaldea gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata, o we di ndu.

3 Otú a ka Jehova siri, Aghaghi inye obodo a n’aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ọ gēwere kwa ya.

4 Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n’ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n’obodo a, na aka ndi Israel nile, n’igwa ha okwu dika okwu ndia: n’ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ.

5 Eze, bú Zedekaia, we si, Le, onye ahu di n’aka-unu: n’ihi na eze abughi onye puru ime ihe ọ bula megide unu.

6 Ha we were Jeremaia, tubà ya n’olùlù Malkija nwa eze, nke di n’ogige ulo-nche: ha we chiri udọ̀ rada Jeremaia. Ma miri adighi n’olùlù ahu, ọ bu nání apiti: Jeremaia we mibe n’apiti ahu.

7 Ebed-melek, bú onye Etiopia, onye bu onozi, nke nọ n’ulo eze, we nuru na ha tiyereri Jeremaia n’olùlù; ma eze nānọdu n’ọnu-uzọ-ama Benjamin;

8 Ebed-melek we si n’ulo eze puta, gwa eze okwu, si,

9 Onye-nwem eze, ndikom ndia emewo ihe ọjọ n’ihe nile nke ha meworo Jeremaia, bú onye-amuma, onye ha tubàworo n’olùlù ahu; o we nọ n’ọnwu n’ọnọdu-ya n’ihi oké unwu: n’ihi na nri adighi kwa ọzọ n’obodo a.

10 Eze we nye Ebed-melek, bú onye Etiopia, iwu, si, Si n’ebe a chiri orú ndikom na iri n’aka-gi, me ka Jeremaia, bú onye-amuma, si n’olùlù ahu rigoputa, tutu ọ nwua.

11 Ebed-melek we chiri ndikom ahu n’aka-ya, ba n’ulo eze n’okpuru ulo-àkù, chiputa n’ebe ahu nkirika ákwà nke dọkara adọka na nkirika ákwà nke kara nká, o we chiri udọ̀ radara ha Jeremaia n’olùlù ahu.

12 Ebed-melek, bú onye Etiopia, we si Jeremaia, Biko, tiye nkirika ákwà ndia nke dọkara adọka na nke kara nká n’okpuru nkpa-abu-gi abua n’okpuru udọ̀. Jeremaia we me otú a.

13 Ha we chiri udọ̀ ahu dọgota Jeremaia, we me ka o si n’olùlù ahu rigoputa: Jeremaia we nọgide n’ogige ulo-nche ahu.

14 Eze, bú Zedekaia, we ziga, kutara onwe-ya Jeremaia, bú onye-amuma, rue nbata nke-atọ nke di n’ulo Jehova: eze we si Jeremaia, Mu onwem gaje iju gi otù ihe; ezonarilam ihe ọ bula.

15 Jeremaia we si Zedekaia, Mb͕e m’gēgosi gi, ì gaghi-eme ka m’nwua n’ezie? ọzọ, mb͕e m’gādu gi ọdu, i gaghi-egem nti.

16 Eze, bú Zedekaia, we ṅuara Jeremaia iyi na nzuzo, si, Jehova nādi ndu, bú Onye ahu nke nyere ayi ndu a, m’gaghi-eme ka i nwua ma-ọli, m’gaghi-enye kwa gi ma-ọli n’aka ndikom ndia ndi nāchọ ndu-gi.

17 Jeremaia we si Zedekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, siri: Ọ buru na i gāpukuru ndi-isi eze Babilon n’ezie, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu, agaghi-esure kwa obodo a n’ọku; i gādi kwa ndu, gi onwe-gi na ulo-gi:

18 ma ọ buru na i pukughi ndi-isi eze Babilon, agēnye kwa obodo a n’aka ndi Kaldea, ha gēsure kwa ya n’ọku, gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n’aka-ha.

19 Eze, bú Zedekaia, we si Jeremaia, Mu onwem nātu egwu ndi-Ju ndi dakuruworo ndi Kaldea, na ha gēnyem n’aka-ha, ha ewe kwam emò.

20 Jeremaia we si, Ha agaghi-enye gi n’aka-ha. Biko, ge nti olu Jehova, n’ihe nke mu onwem nāgwa gi: o we diri gi nma, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu.

21 Ma ọ buru na gi onwe-gi aju na i gaghi-apu, nka bu okwu nke Jehova meworo ka m’hu:

22 Le, ndinyom ahu nile ndi fọduru n’ulo eze Juda gābu ndi emeworo ka ha pukuru ndi-isi eze Babilon, ndinyom ahu ganāsi kwa, Ndi gi na ha di n’udo akpaliwo gi, we nwe ike n’aru gi: ukwu-gi abua emiwo n’apiti, ha we laghachi azu.

23 Ọ bu kwa ndinyom-i nile na umu-gi ka ha ganēme ka ha pukuru ndi Kaldea: gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n’aka-ha, kama aka eze Babilon gējide gi: ọ bu kwa obodo a ka i gēsure n’ọku.

24 Zedekaia we si Jeremaia, Ekwela ka onye ọ bula mara okwu ndia, i gaghi-anwu kwa.

25 Ma mb͕e ndi-isi gānu na mu na gi ekwuwo okwu, ha we biakute gi, si gi, Biko, gosi ayi ihe i gwaworo eze; ezonarila ayi ya, ayi agaghi-eme kwa ka i nwua: gosi kwa ayi ihe eze gwara gi:

26 i gāsi kwa ha, Mu onwem nēme ka aririọ-amaram da n’iru eze, ka ọ ghara ime ka m’laghachi n’ulo Jonatan, inwu n’ebe ahu.

27 Ndi-isi nile we biakute Jeremaia, jua ya: o we gosi ha dika okwu ndia nile si di nke eze nyere ya n’iwu. Ha we debe ọnu-ha du, rapu ya; n’ihi na anughi okwu ahu.

28 Jeremaia we nọgide n’ogige ulo-nche rue ubọchi ewere Jerusalem. O rue, mb͕e ewere Jerusalem,

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 39

1 (n’arọ nke-iteghete nke Zedekaia, bú eze Juda, n’ọnwa nke-iri, ka Nebukadreza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, biaruru Jerusalem, we nọchigide ya n’agha;

2 n’arọ nke-iri-na-otù nke Zedekaia, n’ọnwa nke-anọ, n’ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, ka awapuru n’obodo ahu:)

3 na ndi-isi nile nke eze Babilon batara, we nọdu n’ọnu-uzọ-ama nke etiti, bú Neagal-shareza, na Samga-nebo, na Sasekim, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon fọduru.

4 O rue, mb͕e Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-agha nile huru ha, na ha b͕alagara, were abali si n’obodo ahu pua, n’uzọ ubi eze ab͕ara ogige, n’ọnu-uzọ-ama nke di n’etiti mb͕idi abua: o we pua ga n’uzọ Araba.

5 Usu-ndi-agha nke ndi Kaldea we chua ha n’azu; rue Zedekaia aru n’ala ihe nādighi nke Jeriko: ha we jide ya, me ka ọ rigokuru Nebukadreza, bú eze Babilon, rue Ribla n’ala Hemat, o we kwue okwu ikpé n’ebe ọ nọ.

6 Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia nime Ribla n’anya-ya: ọ bu kwa ndi nile nke Juda amara aha-ha ka eze Babilon b͕uru.

7 O me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n’anya-ya abua, o were kwa ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, ime ka ọ ba Babilon.

8 Ọ bu kwa ulo eze na ulo nile nke ndi Israel ka ndi Kaldea surere n’ọku, ha kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem.

9 Ma ndi Israel nke fọduru, bú ndi fọduru n’obodo ahu, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru ya, na ndi Israel fọduru, bú ndi fọduru n’ebe ahu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri na Babilon.

10 Ma Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ufọdu nime ndi Israel ndi nēnweghi ike, bú ndi nēnweghi ihe ọ bula, fọdu n’ala Juda, o we nye ha ubi-vine na ubi n’ubọchi ahu.

11 Nebukadreza, bú eze Babilon, we nye Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, iwu bayere Jeremaia, si,

12 Were ya, ka anya-gi abua di n’aru ya, eme-kwa-la ya ihe ọjọ ọ bula; kama dika ọ gēsi gwa gi, me ya otú a.

13 Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we ziga, ya na Nebushazban, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon;

14 ha we ziga, weputa Jeremaia n’ogige ulo-nche, nye ya n’aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka o we me ka ọ pua la: o we biri n’etiti ndi Israel.

15 Ọ bu kwa Jeremaia ka okwu Jehova ruru nti, mb͕e ọ nọ ka onye eb͕ochibidoworo n’ogige ulo-nche, si,

16 Je, gwa Ebed-melek, bú onye Etiopia, okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M’gaje ime ka okwum nile biarue obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe; ha gādi kwa n’iru gi n’ubọchi ahu.

17 Ma M’gānaputa gi ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): agaghi-enye kwa gi n’aka ndi ahu gi onwe-gi nātu egwu ha.

18 N’ihi na aghaghm ime ka i wepuga onwe-gi, ọ bughi kwa na mma-agha ka i gāda, kama ndu-gi gāghọrọ gi ihe-nkwata: n’ihi na i b͕abàwo nimem: ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 40

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, zilagasiri ya site na Rema, ka o weresiri ya mb͕e ọ bu onye ejiri nkpọrọ ke ab͕u n’etiti ndi Jerusalem na Juda nile ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú ndi emere ka ha je biri na Babilon.

2 Onye-isi ndi-ob͕ū we were Jeremaia, si ya, Jehova, bú Chineke-gi, kwuru ihe ọjọ a megide ebe a:

3 Jehova we me ka ọ bia, O we me dika O kwuru; n’ihi na unu emehiewo megide Jehova, ma unu egeghi nti olu-Ya, n’ihi nka ka ihe a ruworo unu aru.

4 Ma ub͕u a, le, atọpuwom i ta na nkpọrọ nke di n’aka-gi. Ọ buru na ọ di nma a’anya-gi isorom bia na Babilon, bia, anyam gādi kwa a’aru gi; ma ọ buru na ọ jọrọ njọ n’anya-gi isorom bia na Babilon, ghara: le, ala nka nile di n’iru gi; n’ebe di nma na n’ebe ziri ezi n’anya-gi ije, je n’ebe ahu.

5 Ma mb͕e ọ kālaghachighi, ọ si ya, Ma-ọbu laghachikuru Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye eze Babilon meworo onye-nlekọta obodo nile nke Juda, gi na ya biri n’etiti ndi-gi: ma-ọbu je ebe ọ bula ziri ezi n’anya-gi ije. Onye-isi ndi-ob͕ū we nye ya òkè ihe-oriri na onyinye, zilaga ya.

6 Jeremaia we biakute Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa, ya na ya we biri n’etiti ndi Israel ndi fọduru n’ala-ha.

7 Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n’ọhia, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta n’ala-ha, na o me-kwa-ra ya onye-nlekọta nke ndikom na ndinyom na umu-ntakiri, bú ufọdu nime ndi nēnweghi ike n’ala, nime ndi anēmeghi ka ha je biri na Babilon;

8 ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan na Jonatan, bú umu Karea, na Seraia nwa Tanhumet, na umu Efai, bú onye Netofa, Jezanaia nwa onye Meaka, ha onwe-ha na ndikom-ha.

9 Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si, Unu atula egwu ifè ndi Kaldea: birinu n’ala, fè kwa eze Babilon, ọ gādi-kwa-ra unu nma.

10 Ma mu onwem, le, m’ganēbi na Mizpa, iguzo n’iru ndi Kaldea, ndi gābiakute ayi: ma unu onwe-unu, chikọtanu manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru na manu, tiye ha n’ihe-unu, biri-kwa-nu n’obodo nile unu nke unu wereworo.

11 Ọzọ kwa, ndi-Ju nile ndi nọ na Moab, na n’etiti umu Amon, na n’Edom, na ndi nọ n’ala nile, nuru na eze Babilon enyewo Juda ndi fọduru, na o mewo kwa Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye-nlekọta-ha;

12 ndi-Ju nile we si n’ebe nile achugara ha-ri lata, we bata n’ala Juda, biakute Gedalaia, rue Mizpa, we chikọta manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru nke-uku.

13 Ọzọ, Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n’ọhia, biakutere Gedalaia rue Mizpa,

14 si ya, Ì mara n’ezie na Bealis, bú eze umu Amon, ezitewo Ishmael nwa Netanaia itib͕u gi onwe-gi? Ma Gedalaia nwa Ahaikam ekweghi ihe ha kwuru.

15 Johanan nwa Karea we gwa Gedalaia okwu na nzuzo nime Mizpa, si, Biko, ka m’je, m’gētib͕u kwa Ishmael nwa Netanaia, ma ọ dighi onye ọ bula gāma: n’ihi gini ka o gētib͕u gi onwe-gi, Juda nile ewe b͕asa, bú ndi achikọtaworo n’ebe i nọ, ndi Juda fọduru ewe la n’iyì?

16 Gedalaia nwa Ahaikam we si Johanan nwa Karea, Emela ihe a: n’ihi na okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu bayere Ishmael.