Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 21

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e eze, bú Zedekaia, zigara ya Pashua nwa Malkija, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, si,

2 Biko, juara ayi Jehova ase; n’ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, ebusowo ayi agha: eleghi anya Jehova gēmeso ayi dika oké ọlu-Ya nile si di, we me ka o si n’aru ayi rigo la.

3 Jeremaia we si ha, Otú a ka unu gāsi Zedekaia:

4 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M’ganēchighari ihe agha nile nke di n’aka-unu, nke unu onwe-unu ji ebuso eze Babilon na ndi Kaldea agha, bú ndi nānọchigide unu n’agha n’azu mb͕idi obodo, M’gāchikọta kwa ha n’etiti obodo a.

5 Mu onwem gēbuso kwa unu agha n’aka eseteri eseti, na n’ogwe-aka di ike, ọbuná n’iwe, na n’ọnuma, na n’oké iwe.

6 M’gētib͕u kwa ndi bi n’obodo a, ma madu ma anumanu: n’ajọ ọria uku nēfe efe ka ha gānwu.

7 Ma emesia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-orù-ya, na ndim, bú ndi puru n’ajọ ọria ahu nke nēfe efe, pu kwa na mma-agha, na n’oké unwu, fọduru n’obodo a, nye ha n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n’aka ndi-iro-ha, na n’aka ndi nāchọ ndu-ha: ọ gēji kwa ọnu mma-agha tib͕u ha; ọ gaghi-emere ha ebere, ọ gaghi-enwe kwa ọmiko, ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere.

8 Ndi nka ka i gāsi kwa, Otú a ka Jehova siri: Le, M’nēche n’iru unu uzọ ndu na uzọ ọnwu.

9 Onye nānọgide n’obodo a gānwu site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpu apu, nke nādakuru ndi Kaldea ndi nānọchigide unu n’agha, ọ gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata.

10 N’ihi na edowom irum n’aru obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): n’aka eze Babilon ka agēnye ya, ọ gēsure kwa ya n’ọku.

11 Ma okwu bayere ulo eze Juda, nurunu okwu Jehova:

12 unu ulo Devid, otú a ka Jehova siri, Kpenu ikpe n’ututu, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n’ike n’aka onye-nmeb͕u, ka ọnumam we ghara ipu dika ọku, ghara kwa ire ere nke ọ nādighi onye ganēmenyu ya, n’ihi ihe ọjọ nke omume nile unu.

13 Le, Mu nēmegide gi, gi nwayi bi na ndagwurugwu, gi oké nkume nke ebe di lari, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); unu ndi nāsi, Ònye gāridata imegide ayi? ma-ọbu ònye gābata n’ebe-obibi nile ayi?

14 M’gēwere kwa nmehie-unu leta unu dika nkpuru omume nile unu si di, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): M’gēsuye kwa ọku n’oké ọhia-ya, ọ gērichapu kwa ihe nile di ya buruburu.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 22

1 Otú a ka Jehova siri: Rida n’ulo eze Juda, kwue okwu a n’ebe ahu,

2 si, Nuru okwu Jehova, gi eze Juda, onye nānọkwasi n’oche-eze Devid, gi onwe-gi, na ndi-orù-gi, na ndi-gi ndi nābata n’ọnu-uzọ-ama ndia.

3 Otú a ka Jehova siri: Menu ihe ekpere n’ikpe na ezi omume, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n’ike n’aka onye-nmeb͕u: unu emejọ-kwa-la ọbìa, ma-ọbu nwa-nb͕ei, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru, unu emela ha ihe-ike, unu awusi-kwa-la ọbara nēmeghi ihe ọjọ n’ebe a.

4 N’ihi na ọ buru na unu eme ihe a n’ezie, ndi-eze ndi nānọchi Devid n’oche-eze-ya gābata kwa n’ọnu-uzọ-ama nke ulo a, bú ndi nānọkwasi n’ub͕ọ-ala na n’inyinya, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-ya.

5 Ma ọ buru na unu anughi okwu ndia, ejiwom Onwem ṅu iyi, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na nkpọnkpọ ebe ka ulo a gāghọ.

6 N’ihi na ihe di otú a ka Jehova kwuru bayere ulo eze Juda, si: Gilead ka i burum, bú isi Lebanon: ma aghaghm ime gi ka i ghọ ọzara, na obodo nke madu nēbighi.

7 M’gēdo kwa ndi-nbibi nsọ imegide gi, onye ọ bula na ihe-agha-ya: ha gēb͕utu kwa osisi cedar gi nile kachasi nma, me ka ha dakwasi n’ọku.

8 Ọtutu mba gāgabiga kwa n’akuku obodo a, ha gāsirita kwa ibe-ha n’otù n’otù, N’ìhi gini ka Jehova meworo obodo uku a otú a?

9 Ha gāsi kwa, Ọ bu n’ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-ha, we kpọ isi ala nye chi ọzọ di iche iche, fè ha.

10 Unu akwalara onye nwuru anwu ákwá, unu egosi-kwa-la ya ebere unu nwere n’aru ya: kwasierenu onye-ije ahu ike; n’ihi na ọ gaghi-alata kwa ọzọ, ọ gaghi-ahu kwa ala amuru ya ọzọ.

11 N’ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shalum nwa Josaia, bú eze Juda, nke bu eze n’ọnọdu Josaia, bú nna-ya, nke siri n’ebe a pua, si: Ọ gaghi-alata kwa n’ebe ahu ọzọ;

12 kama n’ebe ahu nke ha mere ya ka ọ je biri, n’ebe ahu ka ọ gānwu, ma ala nka ka ọ nāgaghi-ahu kwa ọzọ.

13 Ahuhu gādiri onye ji ajọ omume ewu ulo-ya, nke ji kwa ikpé nēzighi ezi ewu ime-elu-ya nile; nke nēme ka madu-ibe-ya fè òfùfè n’efu, ọ dighi-enye kwa ya ugwọ-ọlu-ya;

14 onye nāsi, M’gēwuru onwem ulo uku na ime-ulo-elu di iche iche sara mbara, onye nēmere onwe-ya ka window-ya sa mbara; eji kwa osisi cedar machita elu-ya, eji kwa ihe-otite nācha uhie uhie te ya.

15 Ì gābu eze, n’ihi na gi onwe-gi nānu ọku n’obi ika ndi ọzọ n’iji osisi cedar ewu ulo? nna-gi, ò righi ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me kwa ihe ekpere n’ikpe na ezi omume? mb͕e ahu ka ọ diri ya nma.

16 O kpere ikpe onye ewedara n’ala na ob͕enye; mb͕e ahu ka ọ di nma. Nka abughi imaram? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

17 Ma anya-gi abua na obi-gi adighi n’ihe ọ bula ma-ọbughi nání n’urù nēzighi ezi gi, na n’iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, na n’imeb͕u emeb͕u, na n’izọpia-azọpia, ime ya.

18 N’ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si: Ha agaghi-etiri ya aka n’obi, si, Éwù, nwa-nnem nwoke! ma-ọbu, Éwù, nwa-nnem nwanyi! ha agaghi-etiri ya aka n’obi, si, Éwù, onye-nwe-ayi! ma-ọbu, Éwù, ebube-ya!

19 Olìlì nke inyinya-ibu ka agēji lìe ya, agādọrọ ya, tufue ya n’ebe di anya n’azu ọnu-uzọ-ama Jerusalem.

20 Rigo na Lebanon, ti kwa nkpu; me kwa ka olu-gi da udà na Beshan: si kwa n’Abarim tie nkpu; n’ihi na etipiawo ndi nile nāhu gi-ri n’anya.

21 Agwaram i okwu n’udo-gi; ma i siri, M’gaghi-anu. Nka bu uzọ-gi site na mb͕e i di na nwata, na i geghi nti olum.

22 Ndi-ọzùzù-aturu-gi nile ka ifufe gāzù dika aturu, ndi nāhu gi n’anya gēje na ndota-n’agha: n’ezie mb͕e ahu ka ihere gēme gi, agētiye kwa gi n’ọnọdu-ihere, site n’ihe ọjọ gi nile.

23 Gi nwanyi nēbi na Lebanon, nke nālu akwu-gi n’etiti osisi cedar nile, le, ka i si buru onye agēmere amara nke-uku mb͕e ihe-nb͕u nābiakwasi gi, nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme!

24 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ọ buru si na Konaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, bu nb͕a-aka-akàrà n’aka-nrim, ma ọbuná n’ebe ahu ka M’gādọpu gi;

25 M’gēnye kwa gi n’aka ndi nāchọ ndu-gi, na n’aka ndi gi onwe-gi nātu ujọ ha, bú n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n’aka ndi Kaldea.

26 M’gētufu kwa gi na nne-gi onye muru gi, rue ala ọzọ, ebe anāmughi unu; ọ bu kwa n’ebe ahu ka unu gānwu.

27 Ma n’ala ahu nke ha onwe-ha nātukwasi nkpuru-obi-ha, si na ha gālaghachi n’ebe ahu, n’ebe ahu ka ha nagaghi-alaghachi.

28 Ọ̀ bu ite elelìri elelì nke etipiara etipia ka nwoke a, bú Konaia, bu? ọ̀ bu ihe nke nādighi-atọ utọ? gini mere eji tufu ha-ri, ya onye-ya na nkpuru-ya, tukwasi ha n’ala nke ha nāmaghi?

29 Ala, ala, ala, nuru okwu Jehova.

30 Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n’akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n’ubọchi-ya nile: n’ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n’oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 23

1 Ahuhu gādiri ndi-ọzùzù-aturu ndi nēme ka ìgwè ewu na aturu nke ebe-ita-nrim la n’iyì, kpasa ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

2 N’ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a megide ndi-ọzùzù-aturu ndi nāzù ndim dika aturu, si: Unu onwe-unu akpasawo ìgwè ewu na aturu nkem, chusa ha, unu elekọtaghi kwa ha; le, M’gaje iwere ihe ọjọ nke omume nile unu leta unu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

3 Mu onwem gāchikọta kwa ìgwè ewu na aturu nkem fọduru site n’ala nile ebe M’chusaworo ha, M’gēme kwa ka ha lata n’ebe-ita-nri-ha; ha gāmu kwa ọmùmù, ba uba.

4 M’gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu biliere ha, ndi gāzù ha: ha agaghi-atu kwa egwu ọzọ, ha agaghi-atu kwa ujọ, agaghi-ele kwa anya otù efu nime ha na o furu efu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

5 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gēme ka Ihe-opupú nke nēme ezi omume biliere Devid, otù Eze gābu kwa eze, ọ gēnwe kwa uche, me ihe ekpere n’ikpe na ezi omume n’ala nka.

6 N’ubọchi-ya ka agāzọputa Juda, Israel gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha-ya agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi.

7 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na ha agaghi-asi kwa ọzọ, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n’ala Ijipt rigoputa;

8 kama ha gāsi, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka nkpuru ulo Israel si n’ala Ugwu na n’ala nile ebe M’chusara ha-ri rigoputa, bata; ha gēbi kwa n’elu ala nke aka ha.

9 Okwu bayere ndi-amuma. Obim tiwara etiwa nimem, ọkpukpum nile emewo nkpatu; adiwom ka onye ṅubigaworo manya ókè, na dika nwoke nke manya-vine bàworo n’anya nke-uku; n’ihi Jehova, na n’ihi okwu nsọ Ya nile.

10 N’ihi na ala nka juputara na ndi nākwa iko; n’ihi na site n’ọb͕ub͕a-iyi ala nka nēru újú; ebe-ita-nri nile nke ọzara akpọwo nku; ọb͕ub͕a-ọsọ-ha di kwa njọ, idi-ike-ha abughi kwa ihe ziri ezi.

11 N’ihi na emeruwo ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà; e, n’ulom ka M’chọputaworo ihe ọjọ ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

12 N’ihi nka uzọ-ha gādi ha ka ebe nālọ alọ n’oké ọchichiri: agāchu ha, ha ewe dabà nime ya: n’ihi na M’gēme ka ihe ọjọ biakwasi ha, n’arọ nleta-ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

13 Ọ bu kwa n’aru ndi-amuma Sameria ka M’huworo ihe-nzuzu; ha jiri Beal bu amuma, we me ka ndim, bú Israel, kpafue.

14 Ọzọ, n’aru ndi-amuma Jerusalem ka M’huworo ihe jọb͕uru onwe-ya; ha nākwa iko, nējeghari kwa n’okwu-ugha, ha emewo kwa ka aka ndi nēme ihe ọjọ di ike, ha we ghara isi, onye ọ bula n’ihe ọjọ ya, lata: ha nile aghọworom ihe di ka Sọdọm, ndi bi nime ya aghọwo-kwa-ram ihe di ka Gọmọra.

15 N’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ndia, si: Le, M’gaje ime ka ha rie wormwood, M’gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí; n’ihi na ndi-amuma nke Jerusalem ka nmeru puworo je rue ala nka nile.

16 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Unu egela nti n’okwu nile nke ndi-amuma ahu ndi nēburu unu amuma; ndi nēme unu ihe-efu ka ha bu: ọhù nke obi-ha ka ha nēkwu, ha adighi-ekwu site n’ọnu Jehova.

17 Ha nọ nāsi ndi nēlelìm, Jehova ekwuwo okwu, si, Udo gādiri unu; ọ bu kwa onye ọ bula nke nējeghari n’isi-ike nke obi-ya ka ha siworo, Ihe ọjọ agaghi-abiakwasi unu.

18 N’ihi na ònye guzoworo n’ìzù nzuzo nke Jehova, nke ọ gāhu nu kwa okwu-Ya? ònye ṅaworo okwum nti, we nu ya?

19 Le, oké ifufe Jehova, bú ọnuma-Ya, apuwo, ọbuná oké ifufe nēfesi ike buruburu: n’isi ndi nēmebi iwu ka ọ gēfekwasi si-ike.

20 Iwe Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mere ya, ru kwa mb͕e O mere ka ihe-nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia unu gāghọta ya nke-ọma.

21 Eziteghm ndi-amuma ahu, ma ha onwe-ha b͕ara ọsọ: agwaghm ha okwu, ma ha onwe-ha buru amuma.

22 Ma ọ buru na ha guzori n’ìzù nzuzo nkem, ha gēmewori ka ndim nuru okwum nile, ha gēmewori kwa ka ha si n’uzọ ọjọ ha na n’ihe ọjọ nke omume nile ha, lata.

23 Ọ̀ bu Chineke nke nọ nso ka M’bu, ghara ibu Chineke nọ n’ebe di anya? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

24 Ọ̀ di onye ọ bula gēzobe onwe-ya n’ebe ọ bula di nzuzo, Mu onwem we ghara ihu ya anya? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi elu-igwe na uwa ka M’juputara? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

25 Anuwom ihe ahu nke ndi-amuma siri, bú ndi nēbu amuma agha n’aham, si, Arọwom nrọ, arọwom nrọ.

26 Rùe ole mb͕e ka nka gādi n’obi ndi-amuma ndi nēbu amuma ugha; bú ndi-amuma nke nēbu amuma aghughọ nke obi-ha?

27 Ndi nēchè èchìchè ime ka ndim chezọ aham site na nrọ nile ha nke ha nēzeritara ibe-ha n’otù n’otù, dika ndi bu nna-ha chezọrọ aham site na Beal.

28 Onye-amuma nke nrọ di ya n’ọnu, ya ze nrọ-ya; ọzọ, onye ahu okwum di ya n’ọnu, ya kwue okwum n’ezi-okwu. Gini ka okporo-ọka na ọka wheat nwekọrọ? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

29 Ọ̀ bughi otú a ka ọ di? na okwum di ka ọku, (ọ bu ihe sin’ọnu Jehova puta); na dika otùtù nke nētipia nkume di elu?

30 N’ihi nka, le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọbu ihe si n’ọnu Jehova puta), bú ndi nēzu okwum nile n’ori, onye ọ bula n’aka ibe-ya.

31 Le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), bú ndi nēwere ire-ha kwue ihe, si, Ọ bu ihe si Ya n’ọnu puta.

32 Le, Mu nēmegide ndi nēbu amuma nrọ ugha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ha we ze ha, me ka ndim kpafue site n’okwu-ugha nile ha na n’obi-ha nādighi n’otù ebe: ma Mu onwem eziteghi ha, enyeghkwam ha iwu; ọ dighi kwa urù ha gābara ndi nka ma-ọli; ọ bu ihe si n’onu Jehova puta.

33 Ma mb͕e ndi nka, ma-ọbu onye-amuma, ma-ọbu onye-nchu-àjà, gāju gi, si, Gini bu ibu Jehova nēbo? I gasi kwa ha, Gini bu ibu? ọ bu na arapuwom unu; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

34 Ma onye-amuma ahu, ma-ọbu onye-nchu-àjà ahu, ma-ọbu ndi ahu, nke gāsi, Le, ibu Jehova nēbo: M’gēwere kwa nmehie-ya leta nwoke ahu, leta kwa ulo-ya.

35 Otú a ka unu gāsirita ibe-unu n’otù n’otù, sirita kwa nwa-nne-unu n’otù n’otù, Gini ka Jehova zaworo? na, Gini ka Jehova kwuworo?

36 Ma ibu Jehova ka unu nāgaghi-ehota kwa ọzọ: n’ihi na ibu eboro onye ọ bula bu okwu nke aka ya; unu ab͕anwewo kwa okwu nile nke Chineke di ndu, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ayi.

37 Otú a ka i gāsi onye-amuma, Gini ka Jehova zaworo gi? na, Gini ka Jehova kwuworo?

38 Ma ọ buru na unu asi, Le, ibu Jehova nēbo; n’ihi nka ka Jehova ji si otú a: N’ihi na unu ekwuwo okwu a, si, Le, ibu Jehova nēbo, ma eziteworom unu ozi, si, Unu asila, Le, ibu Jehova nēbo;

39 n’ihi nka, le, Mu onwem, M’gēchezọsi kwa unu, chupu unu na obodo ahu nke M’nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, n’irum:

40 M’gētiyekwasi kwa unu ita-uta di mb͕e ebighi-ebi, ya na itiye n’ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi, nke agaghi-echezọ echezọ.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 24

1 Jehova we me ka m’hu, ma, le, nkata fig abua adọbara n’iru ulo uku nke Jehova; mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, mesiri ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi-isi Juda, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, si na Jerusalem je biri n’ala ọzọ, we me ka ha biarue Babilon.

2 Fig nke di nma nke-uku di n’otù nkata, dika fig nke buru uzọ cha: ma fig nke jọrọ njọ nke-uku di na nkata nke-ọzọ, nke anāgaghi-eri, site n’ijo-njọ-ha.

3 Jehova we sim, Gini ka onwe-gi nāhu, Jeremaia? M’we si, Fig; ndi bu ezi fig di nma nke-uku; ma ndi bu fig ọjọ jọrọ njọ nke-uku, nke anāgaghi-eri eri, site n’ijọ-njọ-ha.

4 Okwu Jehova we ruem nti, si,

5 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri; Dika ezi fig ndia, otú a ka M’gāmata ndi Juda emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ndi M’siri n’ebe a ziga n’ala ndi Kaldea, ime ha nma.

6 N’ihi na M’gātukwasi ha anyam ime ha nma, M’gēme kwa ka ha lata n’ala nka: M’gēwu kwa ha dika ulo, ghara ikwada ha; M’gāku kwa ha dika osisi, ghara iropu ha.

7 M’gēnye kwa ha obi imaram, na Mu onwem bu Jehova: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke: n’ihi na ha gēji obi-ha nile laghachikutem.

8 Ma dika fig ọjọ ndia, nke anāgaghi-eri eri, site n’ijọ-njọ-ha; n’ezie otú a ka Jehova siri, Otú a ka M’gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya, na ndi Jerusalem fọduru, bú ndi fọduru n’ala nka, na ndi bi n’ala Ijipt, nye:

9 M’gēwere ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, iburu ha ihe ọjọ; ibu ihe-ita-uta, na ilu, na ihe-àkùkù, na ihe-nkọcha, n’ebe nile M’gāchusa ha.

10 M’gēziga kwa mma-agha na oké unwu na ajọ ọria nēfe efe n’etiti ha, rue mb͕e agēme ka ha gwupusia n’elu ala ahu nke M’nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 25

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi Juda nile n’arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda; nke ahu bu arọ mbu nke Nebukadreza, bú eze Babilon;

2 bú okwu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara ndi Juda nile, gwa ndi nile bi na Jerusalem, si:

3 Site n’arọ nke-iri-na-atọ nke Josaia nwa Emon, bú eze Juda, we rue ta, orú arọ na ato ndia, ka okwu Jehova ruworom nti, m’we gwa unu, nēbili n’isi-ututu nēkwu; ma unu anughi.

4 Jehova ezitewo-kwa-ra unu ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma, nēbili n’isi-ututu nēzite ha; ma unu anughi, unu atọghi kwa nti-unu n’ala inu;

5 nāsi, Biko, latanu, onye ọ bula ya si n’uzọ ọjọ ya na n’ihe ọjọ nke omume nile unu lata, biri-kwa-nu n’elu ala nke Jehova nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n’iru:

6 unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha na ikpọ isi ala nye ha, unu eji-kwa-la ọlu aka-unu kpasum iwe; M’gaghi-eme kwa unu ihe ọjọ.

7 Ma egeghm nti, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ka unu we were ọlu aka-unu kpasuem iwe, ime onwe-unu ihe ọjọ.

8 N’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a: N’ihi na unu anughi okwum nile,

9 le, M’gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M’gēzigara ozi, M’gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M’gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M’gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.

10 Ọzọ, M’gēme ka olu obi-utọ, na olu ọṅù, na nwoke nālu nwunye ọhu, na olu nwanyi anālu ọhu, na olu nkume-igwe-nri, na ìhè oriọna, lanari ha n’iyì.

11 Ala nka nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe na ihe-iju-anya; mba ǹdia gēfè kwa eze Babilon ọgu arọ na iri.

12 O gēru kwa, mb͕e ọgu arọ na iri ruzuru, na M’gēwere ajọ omume ha leta eze Babilon, leta kwa mba ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), leta kwa ala Kaldea; M’gēme kwa ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu mb͕e ebighi-ebi.

13 M’gēme kwa ka okwum nile biakwasi ala ahu, bú okwu nke M’kwuworo megide ya, bú amuma nile edeworo n’akwukwọ a, nke Jeremaia buworo megide mba nile.

14 N’ihi na ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ha fè ha òfùfè, ọbuná ha onwe-ha: M’gākwughachi kwa dika omume nile ha si di, na dika ọlu nke aka-ha si di.

15 N’ihi na otú a ka Jehova, bu Chineke nke Israel, sirim: Nara iko manya nke ọnuma nka n’akam, me ka mba nile ṅua ya, bú ndi Mu onwem nēziga gi jekuru.

16 Ha gāṅu kwa, we ṅaghari, wi ara, n’ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n’etiti ha.

17 M’we nara iko ahu n’aka Jehova, me ka mba nile ṅua, bú ndi Jehova zigaram jekuru:

18 bú Jerusalem, na obodo nile nke Juda, na ndi-eze-ya, na ndi-isi-ya, ime ha nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na ihe-nkọcha; dika o si dì ta;

19 Fero, bú eze Ijipt, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ya nile;

20 na ndi nile gwara, ọgwa na eze nile nke ala Uz, na eze nile nke ala ndi Filistia, na Ashkelon, na Geza, na Ekron, na ndi Ashdod fọduru;

21 na Edom, na Moab, na umu Amon;

22 na eze nile nke Taia, na eze nile nke Zaidon, na ndi-eze nke agwe-etiti nke di n’ofè oké osimiri;

23 Dedan, na Tima, na Buz, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha;

24 na eze nile nke Arebia, na eze nile nke ndi gwara ọgwa ndi bi n’ọzara;

25 na eze nile nke Zimri, na eze nile nke Ilam, na eze nile nke Midia;

26 na eze nile nke Ugwu, ma ndi bi nso ma ndi bi n’ebe di anya, onye na ibe-ya; na ala-eze nile nke uwa, nke di n’elu uwa: eze Shishak gāṅuso kwa ha.

27 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ṅuanu, ṅubiga ókè, b͕ọ ab͕ọ, da, unu ebili-kwa-la ọzọ, n’ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n’etiti unu.

28 Ọ gēru kwa, mb͕e ha gāju inara iko ahu n’aka-gi iṅu, na i gāsi ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Unu aghaghi iṅu.

29 N’ihi na, le, ọ bu n’obodo ahu nke akpọkwasiri aham ka Mu onwem nāmalite ime ihe ọjọ, ma unu onwe-unu, ùnu gābu ndi anāmaghi ikpe ma-ọli? Unu agaghi-abu ndi anāmaghi ikpe: n’ihi na mma-agha ka Mu onwem nākpọ ka ọ dakwasi ndi nile bi n’uwa; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

30 Ma gi onwe-gi gēburu ha amuma okwu nile ndia, si ha Jehova gēsi n’elu bib͕ọ, si kwa n’ebe-obibi-Ya di nsọ me ka olu-Ya da udà; Ọ gēbib͕osi ebe-ita-nri-Ya ike; nkpu dika ndi nāzọcha nkpuru-vine ka Ọ gēti imegide ndi nile bi n’uwa.

31 Nkpọtu nābiaru nsọtu uwa; n’ihi na Jehova nwere okwu-ikpé megide mba nile, Ya na anu-aru nile, bú madu, ganēje ikpe; ma ndi nēmebi iwu, Ọ’gēwere ha nye mma-agha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

32 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, ihe ọjọ nāpu si n’otù mba jerue mba ọzo, agākpọte kwa oké ifufe site na nsọtu nile nke uwa.

33 Ndi Jehova b͕uru gādizu kwa n’ubọchi ahu site n’otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa: agaghi-etiri ha aka n’obi, agaghi-achikọta kwa ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n’elu ala ka ha gāghọ.

34 Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n’etiti ìgwè ewu na aturu: n’ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M’gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike.

35 Ebe-nb͕alaga alanariwo kwa ndi-ọzùzù-aturu, nb͕apu alanariwo ndi di ebube n’etiti ìgwè ewu na aturu.

36 Ge nti olu iti-nkpu nke ndi-ọzùzù-aturu, na nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi di ebube n’etiti ìgwè ewu na aturu! n’ihi na Jehova nēbibi ebe-ita-nri-ha.

37 Emewo kwa ka ulo-obibi nile nke di n’udo dere du site n’iwe di ọku nke Jehova.

38 Ọ rapuwo okwu-ọhia-Ya, dika ọdum: n’ihi na ala-ha aghọwo ihe-iju-anya site n’idi-ọku nke mma-agha nēme ihe-ike, na site n’iwe-Ya di ọku.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 26

1 Na nmalite nke ọbubu-eze Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, ka okwu a sitere na Jehova, si,

2 Otú a ka Jehova siri: Guzo n’ogige ulo Jehova, gwa obodo nile nke Juda, bú ndi nābia ikpọ isi ala n’ulo Jehova, okwu nile nke M’nyere gi n’iwu igwa ha; agubìla otù nime ha.

3 Eleghi anya ha gānu, we lata, onye ọ bula o si n’uzọ ọjọ ya lata; ka M’we chègharia n’ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēchè ime ha n’ihi ihe ọjọ nke omume nile ha.

4 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu egeghm nti, ijehari n’iwum nke M’tiyeworo n’iru unu,

5 ige nti okwu nile nke ndi-orùm, bú ndi-amuma, ndi Mu onwem nēzitere unu, nēbili kwa n’isi-ututu nēzite ha, ma unu egeghi nti;

6 M’gēme kwa ka ulo a di ka Shailo, ọ bu kwa obodo a ka M’gēme ka ọ ghọrọ mba nile nke uwa ihe-nkọcha.

7 Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile we nu ka Jeremaia nēkwu okwu ndia n’ulo Jehova.

8 O rue, mb͕e Jeremaia kwubìri okwu nile nke Jehova nyere ya n’iwu igwa ndi Israel nile, na ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile jidere ya, si, I ghaghi inwu anwu.

9 Gini mere i buworo amuma n’aha Jehova, si, Ulo a gādi ka Shailo, obodo a gābu kwa nkpọnkpọ ebe, ghara inwe onye-obibi? Ewe kpọkọta ndi Israel nile n’ebe Jeremaia nọ n’ulo Jehova.

10 Ndi-isi Juda we nu ihe ndia, ha we si n’ulo eze rigota n’ulo Jehova; ha we nọdu ala n’oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova.

11 Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma we gwa ndi-isi na ndi Israel nile okwu, si, Ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n’ihi na o buwo amuma megide obodo a, dika unu jiworo nti-unu nu.

12 Jeremaia we gwa ndi-isi nile, gwa ndi Israel nile, okwu, si, Jehova ziterem ibu amuma okwu nile nke unu nuworo megide ulo a na imegide obodo a.

13 Ma ub͕u a menu ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma, ge-kwa-nu nti olu Jehova, bú Chineke-unu; Jehova gēchèghari kwa n’ihe ọjọ ahu nke O kwuworo megide unu.

14 Ma mu onwem, le, adim n’aka-unu: menum ka o si di nma na ka o si zie ezie n’anya-unu.

15 Nání, maranu nke-ọma na, ọ buru na unu eme ka m’nwua, ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ ka unu onwe-unu nātukwasi n’aru unu, na n’aru obodo a, na n’aru ndi bi ya: n’ihi na n’ezi-okwu Jehova ezitewom ibiakute unu ikwu okwu ndia nile na nti-unu.

16 Ndi-isi na ndi Israel nile we si ndi-nchu-àjà, si kwa ndi-amuma, Ọ dighi ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n’ihi na ọ bu n’aha Jehova, bú Chineke-ayi, ka gwaworo ayi okwu.

17 Ufọdu nime ndi-okenye ala we bilie, gwa nkpọkọta ahu nile nke ndi Israel okwu, si,

18 Maika onye Moreshet nēburi amuma n’ubọchi Hezekaia, bú eze Juda; o we gwa ndi Juda nile okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agēji ploughi gwu Zaion dika ubi, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.

19 Hezekaia, bú eze Juda, na Juda nile, hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? ọ̀ tughi egwu Jehova, we chọ ka iru Jehova dajua, Jehova we chègharia n’ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha? Ma ayi onwe-ayi nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi-ayi.

20 Ọzọ kwa, otù nwoke di nke nēbu amuma n’aha Jehova, bú Uraia nwa Shemaia nke sitere na Kiriat-jearim; o we bue amuma megide obodo a, megide kwa ala nka, dika okwu nile nke Jeremaia si di:

21 Jehoiakim, bú eze, na ndi-dikei ya nile, na ndi-isi nile, we nu okwu-ya nile, eze we chọ ime ka ọ nwua; Uraia we nu ya, tua egwu, b͕alaga, we ba n’Ijipt:

22 Jehoiakim, bú eze, we ziga ndikom n’Ijipt, bú Elnetan nwa Akboa, na ndikom ufọdu so ya, ijeru Ijipt:

23 ha we me ka Uraia si n’Ijipt puta, ha we me ka ọ biakute eze, bú Jehoiakim; o we were mma-agha tibue ya, tubà ozu-ya n’ílì umu ndi Israel.

24 Ma otú ọ di, aka Ahaikam nwa Shefan di n’akuku Jeremaia, ka ha we ghara inye ya n’aka ndi Israel ime ka ọ nwua.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 27

1 Na nmalite ọbubu-eze Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, ka okwu a ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2 Otú a ka Jehova sirim: Mere onwe-gi ab͕u di iche iche na nkpọrọ di iche iche, tukwasi ha n’olu-gi;

3 chiri ha zigara eze Edom, ziga-kwa-ra eze Moab, ziga-kwa-ra eze umu Amon, ziga-kwa-ra eze Taia, ziga-kwa-ra eze Zaidon, site n’aka ndi-ozi ndi nābiaru Jerusalem nābiakute Zedekaia, bú eze Juda;

4 nye ha iwu inye ndi-nwe-ha, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi ndi-nwe-unu;

5 Mu onwem emewo uwa, na madu na anumanu nke di n’elu uwa, site n’ikem di uku, site kwa n’ogwe-akam nke eseteri eseti; ewerewokwam ya nye onye o ziri ezi n’anyam inye.

6 Ma ub͕u a Mu onwem enyewo ala nile ndia n’aka Nebukadneza, bú eze Babilon, bú orùm; ọzọ kwa, anu ọhia ka M’nyeworo ya ifè ya.

7 Mba nile gēfè kwa ya na nwa-ya na nwa nwa-ya òfùfè rue mb͕e mb͕e ala-ya biara: mb͕e ahu ya onwe-ya ka ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ọ fè ha òfùfè.

8 O gēru kwa, na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè onye ahu, bú Nebukadneza eze Babilon, nke nāgaghi-etiye kwa olu-ya na yoke nke eze Babilon, M’gēji mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ajọ ọria nēfe efe, leta mba ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), rue mb͕e M’mere ka ha gwusia site n’aka-ya.

9 Ma unu onwe-unu, unu egela ndi-amuma-unu nti, ege-kwa-la ndi-unu nāju arusi ase, ege-kwa-la nrọ nile unu, ege-kwa-la ndi-unu nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ege-kwa-la ndi-mb͕asi-unu, ndi nāgwa unu okwu, si, Unu agaghi-efe eze Babilon:

10 n’ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu, ime ka unu si n’ala-unu je n’ebe di anya: ka M’we chupu kwa unu, unu ewe la n’iyì.

11 Ma mba ahu nke gēme ka olu-ya ba na yoke nke eze Babilon, nke gēfe kwa ya, M’gēkwe kwa ka mba ahu nọdu n’elu ala-ya, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); ha gālu kwa ya, biri kwa nime ya.

12 Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, ka m’gwara okwu dika okwu nile ndia si di, si, Menu ka olu-unu ba na yoke nke eze Babilon, fè-kwa-nu ya na ndi-ya, we di ndu.

13 N’ìhi gini ka unu gānwu, gi onwe-gi na ndi-gi, site na mma-agha, na site n’oké unwu, na site n’ajọ ọria nēfe efe, dika Jehova kwuworo bayere mba ahu nke nāgaghi-efe eze Babilon?

14 Ma unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma ndi nāgwa unu okwu, si, Unu agaghi-efé eze Babilon: n’ihi na amuma ugha ka ha nēburu unu.

15 N’ihi na eziteghm ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ma ha onwe-ha nēbu amuma ugha n’aham; ka M’we chupu unu, unu ewe la n’iyì, unu onwe-unu na ndi-amuma ndi nēburu unu amuma.

16 Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà na ndi nka nile ka m’gwara okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma-unu ndi nēburu unu amuma, si, Le, agaje isi na Babilon welata ihe nile nke ulo Jehova ub͕u a ngwa ngwa: n’ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu.

17 Unu egela ha nti; fènu eze Babilon, we di ndu: n’ìhi gini ka obodo a gāghọ nkpọnkpọ ebe?

18 Ma ọ buru na ndi-amuma ka ha bu, ọ buru na okwa na okwu Jehova di ha n’ọnu, biko, ka ha riọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha aririọ, ka ihe nile nke fọduru n’ulo Jehova, na n’ulo eze Juda, na nime Jerusalem, we ghara ibà na Babilon.

19 N’ihi na okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru bayere ogidi nile, baye-kwa-ra oké osimiri ahu, baye-kwa-ra ihe-ndọkwasi nile, baye-kwa-ra ihe fọduru, bú nke fọduru n’obodo a,

20 nke Nebukadneza, bú eze Babilon, nāchighi, mb͕e o mere ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, si na Jerusalem je biri na Babilon, ya na ndi Juda na Jerusalem nile amara aha-ha;

21 e, okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Irael, kwuru bayere ihe nile fọduru n’ulo Jehova na n’ulo eze Juda, na nime Jerusalem, si:

22 na Babilon ka agēbubà ha, ọ bu kwa n’ebe ahu ka ha gādi, rue ubọchi M’gēleta ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); mb͕e ahu ka M’gēbugota ha, bulata n’ebe a.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 28

1 O rue, n’arọ ahu, na nmalite ọbubu-eze Zedekaia, bú eze Juda, n’arọ nke-anọ, n’ọnwa nke-ise, na Hananaia nwa Azua, bú onye-amuma, nke sitere na Gibeon, gwaram okwu n’ulo Jehova, n’anya ndi-nchu-àjà na ndi Israel nile, si,

2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, Ab͕ajiwom yoke nke eze Babilon.

3 Tutu ogologo arọ abua eruzue Mu onwem ganēbulata nēbe a ihe nile nke ulo Jehova, nke Nebukadneza, bú eze Babilon, siri n’ebe a bupu, we bubà ha na Babilon:

4 ọzọ, Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi Juda nile emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú ndi bàworo na Babilon, ndia ka Mu onwem gaje ime ka ha lata n’ebe a, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): n’ihi na M’gab͕aji yoke nke eze Babilon.

5 Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, n’anya ndi-nchu-àjà, na n’anya ndi Israel nile ndi nēguzo n’ulo Jehova,

6 o we si, bú Jeremaia onye-amuma, Amen: Jehova me otú a: Jehova me ka okwu-gi nile guzosie ike, bú nke i buworo amuma, ime ka ihe nile nke ulo Jehova, na ndi nile emere ka je biri n’ala ọzọ, si na Babilon lata n’ebe a.

7 Nání, biko, nuru okwua nke mu onwem nēkwu na nti-gi abua, na na nti ndi nka nile:

8 Ndi-amuma ndi burum uzọ, ndi buru kwa gi uzọ, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ha we bue amuma megide ọtutu ala, megide kwa ala-eze uku di iche iche, bayere agha, baye-kwa-ra ihe ọjọ, baye-kwa-ra ajọ ọria nēfe efe.

9 Onye-amuma nke nēbu amuma bayere udo, mb͕e okwu onye-amuma ahu gērè, agāmara onye-amuma ahu, na Jehova ezitewo ya n’ezie.

10 Hananaia, bú onye-amuma, we kopu nkpọrọ ahu n’olu Jeremaia, bú onye-amuma, we b͕ajie ya.

11 Hananaia we kwue okwu n’anya ndi Israel nile, si, Otú a ka Jehova siri: Ọbuná otú a ka M’gāb͕ajipu yoke nke Nebukadneza, bú eze Babilon, n’olu mba nile tutu ogologo arọ abua eruzue. Jeremaia, bú onye-amuma, we la.

12 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e Hananaia, bú onye-amuma, b͕ajipusiri nkpọrọ n’olu Jeremaia, bú onye-amuma, si,

13 Je, gwa Hananaia okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Nkpọrọ osisi ka i b͕ajiworo; ma i mewo nkpọrọ ígwè n’ọnọdu ha.

14 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Yoke nke ígwè ka M’tukwasiworo n’olu mba nile ndia, ka ha we fè Nebukadneza, bú eze Babilon; ha gēfè kwa ya: ọzọ, anu ọhia ka M’nyeworo ya.

15 Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, Biko, nuru, Hananaia; Jehova eziteghi gi; ma gi onwe-gi emewo ka ndi nka tukwasi okwu-ugha obi.

16 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M’gaje isi n’elu uwa zilaga gi: n’arọ a ka gi onwe-gi gānwu, n’ihi na okwu nwezuga ka i kwuworo megide Jehova.

17 Hananaia, bú onye-amuma, we nwua n’arọ ahu n’ọnwa nke-asa.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 29

1 Ma ndia bu okwu nke akwukwọ ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, si na Jerusalem zigara ndi-okenye fọduru nime ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, nke o ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-amuma, ziga-kwa-ra ndi Israel nile, ndi Nebukadneza mere ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:

2 (mb͕e Jekonaia, bú eze, na eze-nwanyi, na ndi-onozi, na ndi-isi Juda na Jerusalem, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, pusiri na Jerusalem;)

3 site n’aka Elasa nwa Shefan, na Gemaraia nwa Hilkaia, (ndi Zedekaia, bú eze Juda, zigara Nebukadneza, bú eze Babilon, rue Babilon,) si,

4 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri ndi nile emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú ndi M’meworo ka eme ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:

5 Wuenu ulo, biri; kukwa-nu ihe n’ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha;

6 luanu nwunye, mua umu-ndikom na umu-ndinyom; lu-kwa-ranu umu-unu ndikom nwunye, lu-kwa-ranu umu-unu ndinyom di, ka ha we mua umu-ndikom na umu-ndinyom; ba-kwa-nu uba n’ebe ahu, ghara ibilata.

7 Chọ-kwa-nu udo nke obodo ahu nke M’meworo ka eme ka unu je biri n’ebe ahu, kpe-kwa-ranu Jehova ekpere bayere ya: n’ihi na n’udo-ya ka udo gādiri unu.

8 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu ekwela ka ndi-amuma-unu ndi nọ n’etiti unu, na ndi-unu ndi nāju arusi ase, rafue unu, unu ege-kwa-la nti nrọ nile unu nke unu onwe-unu nēme ka arọ ha.

9 N’ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu n’aham: eziteghm ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

10 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M’gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n’ime ka unu lata n’ebe a.

11 N’ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n’iru na ntukwasi-obi.

12 Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M’gēge kwa unu nti.

13 Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm.

14 M’gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gēme kwa ka ndi-unu adọtara n’agha lata, M’gēsi kwa na mba nile, na n’ebe nile M’chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); M’gēme kwa ka unu lata n’ebe ahu nke M’mere ka unu si n’ebe ahu je biri n’ala ọzọ.

15 N’ihi na unu asiwo, Jehova emewo ka ndi-amuma biliere ayi nime Babilon.

16 N’ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere eze ahu nke nānọkwasi n’oche-eze Devid, baye-kwa-ra ndi nka nile nke bi n’obodo a, bú umu-nne-unu ndi nēsoghi unu pua ije n’ala ọzọ ebe emere ka unu je biri;

17 otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, M’gaje iziga n’etiti ha mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe, M’gēme kwa ha ka ha di ka fig jọb͕uru onwe-ha, nke anāgaghi-eri eri, site n’ijọ-njọ-ha.

18 M’gēji kwa mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ọria nēfe efe, chuso ha, M’gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, ibu ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, na ibu ihe-ita-uta, n’etiti mba nile ebe M’chugaworo ha:

19 n’ihi na ha egeghi nti okwum nile, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), nke M’zigara ha ndi-orùm, bú ndi-amuma, igwa ha, nēbili n’isi-ututu nēziga ha; ma unu egeghi nti; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

20 Ma unu onwe-unu, nurunu okwu Jehova, unu ndi nile emere ka unu je biri n’ala ọzọ, ndi M’zigara si na Jerusalem rue Babilon.

21 Okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere Ehab nwa Kolaia, baye-kwa-ra Zedekaia nwa Maaseia, ndi nēburu unu amuma ugha n’aham, si: Le, M’gaje inye ha n’aka Nebukadreza, bú eze Babilon; o gētib͕u kwa ha n’anya-unu;

22 agēsite kwa na ha bulie nkọcha, nke ndi Juda nile emere ka ha je biri n’ala ọzọ ndi nọ na Babilon gēji kọcha, si, Jehova me gi ka i di ka Zedekaia na dika Ehab, ndi eze Babilon rub͕uru n’ọku:

23 n’ihi na ha emewo ihe-nzuzu n’Israel, we kwa nwunye ndikom-ibe-ha iko, kwu kwa okwu n’aham n’ugha, bú nke M’nēnyeghi ha n’iwu; ma Mu onwem bu onye mara, na onye-àmà; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

24 Ọzọ, okwu bayere Shemaia, bú onye-Nehelamait, ka i gēkwu, si,

25 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, N’ihi na gi onwe-gi ezigaworo ndi nka nile ndi bi na Jerusalem, ziga-kwa-ra Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà nile, akwukwọ n’aha-gi, si,

26 Jehova emewo gi onye-nchu-àjà n’ọnọdu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, ka ndi-nlekọta we di n’ulo Jehova, imeso onye ọ bula nāwi ara, nke nēme kwa onwe-ya onye-amuma, ka i we tiye ya n’ọtọsi na nime nkpọrọ olu.

27 Ma ub͕u a, n’ìhi gini ka i nābasighi Jeremaia onye Anatot nba ike, onye nēme onwe-ya onye-amuma n’ebe unu nọ,

28 n’ihi na o ziteworo ayi ozi na Babilon, si, Mb͕e unu gēbi n’ala ọzọ di anya: wuenu ulo, biri; kuanu ihe n’ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha?

29 Zefanaia, bú onye-nchu-àjà, we gua akwukwọ a na nti Jeremaia, bú onye-amuma.

30 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

31 Zigara ndi nile emere ka ha je biri n’ala ọzọ, si, Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shemaia onye-Nehelamait, si: N’ihi na Shemaia ebuworo unu amuma, ma Mu onwem eziteghi ya, o we me ka unu tukwasi okwu-ugha obi;

32 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M’gaje iji nmehie Shemaia onye-Nehelamait leta ya, leta kwa nkpuru-ya; ọ gaghi-enwe nwoke ọ bula nēbi n’etiti ndi nka, ọ gaghi-elekwasi kwa ezi ihe ahu anya, bú nke Mu onwem nēmere ndim, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): n’ihi na okwu nwezuga ka o kwuworo megide Jehova.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 30

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, Dere onwe-gi n’akwukwọ okwu nile nke M’gwaworo gi.

3 N’ihi na, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gēme ka ndim lata, bú Israel na Juda, ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); M’gēme kwa ka ha lata n’ala ahu nke M’nyere ndi bu nna-ha, ha gēnweta kwa ya.

4 Ma ndia bu okwu nke Jehova kwuru bayere Israel, baye-kwa-ra Juda.

5 N’ihi na otú a ka Jehova siri: Olu nke ọma-jijiji ka ayi nuworo; egwu di, ma udo adighi.

6 Biko, juanu, hu ma ime nēme nwoke: gini mere M’huworo ndikom nile n’otù ka aka-ha di n’úkwù-ha, dika nwanyi ime nēme, iru nile ab͕anwewo kwa we di ka nke ozu?

7 Éwù! n’ihi na ub͕ochi ahu di uku, ọ dighi kwa ubọchi nke di ka ya: ọbuná mb͕e ahuhu ka ọ buru Jekob; ma agēsi nime ya zọputa ya.

8 Ọ gēru kwa n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M’gāb͕ajipu yoke-ya n’olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M’gētibì; ndi ala ọzọ agaghi-eme kwa ka ọ fè ha òfùfè ọzọ:

9 ma ha gēfè Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha, onye M’gēme ka o biliere ha.

10 Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n’ihi na, le, M’gaje izọputa gi n’ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n’ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n’aru bū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.

11 N’ihi na gi ka M’nọyere, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), izọputa gi: n’ihi na M’gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M’chusaworo gi, ma otú ọ di, gi ka M’nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M’gādọ gi aka na nti n’ikpé, M’gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli.

12 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Ihe nādighi ngwọta ka nb͕aji aka na ukwu gi bu, ọnyá-gi etiputara etiputa jọrọ njọ.

13 Ọ dighi onye nēkpe ọnu-gi: ọ dighi ọgwu ntechi i nwere.

14 Ndi nile ndi nāhu gi n’anya echezọwo gi; ha adighi-achọ gi: n’ihi na otiti nke onye-iro, bú idọ-aka-na-nti nke onye nēnweghi obi-ebere, ka M’wereworo tie gi; n’ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, n’ihi na nmehie-gi nile nwere ume.

15 Gini mere i ji ti nkpu bayere nb͕aji aka na ukwu gi? ihe nādighi ngwọta ka ihe-nb͕u-gi bu: n’ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, n’ihi na nmehie-gi nile nwere ume, ka M’meworo gi ihe ndia.

16 N’ihi nka agēripia ndi nile nēripia gi; ọzọ, ndi nile ndi nākpab͕u gi, ha nile, na ndọta-n’agha ka ha gāla; ndi nāpunara gi ihe gāghọ ihe apunaraworo n’aka madu, ọ bu kwa ndi nile nke nāluta ihe-gi n’agha ka M’gēnye ka ha ghọ ihe-nluta-n’agha.

17 N’ihi na M’gēme ka anu-aru ọhu puchie n’aru gi, M’gāgwọpu kwa gi n’ọnyá-gi nile etiputara, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); n’ihi na Nwanyi achupuru achupu ka ha kpọworo gi, si, Zaion ka ọ bu, ọ dighi onye nāchọ ya.

18 Otú a ka Jehova siri: Le, M’gaje ime ka ulo-ikwū nile nke Jekob adọtara n’agha lata, ọ bu kwa n’aru ebe-obidi-ya nile ka M’gēnwe obi-ebere; agēwu kwa obodo n’elu obo-ya, agēbi kwa n’ulo-elu-ya dika esiri ebi ya.

19 Ekele na olu nke ndi-ngwuri gēsi kwa nime ha puta: M’gēme kwa ka ha ba uba, ha agaghi-adi kwa ole-na-ole; M’gēme kwa ka ha di nsọpuru ha agaghi-adi kwa ntà.

20 Umu-ha gādi kwa ka ha si di na mb͕e ochie, nzukọ-ha gēguzosi kwa ike n’irum, M’gēji kwa nmehie nke ndi nile nēmeb͕u ya leta ha.

21 Ọzọ, onye-ebube nke Jekob gābu onye sitere na ya, onye nāchi ya gēsi kwa n’etiti ya puta; M’gēme kwa ka ọ biarue nso, o we biakutem nso: n’ihi na ònye ka onye a bu nke nọworo obi-ya mbé ibiakutem nso? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

22 Unu gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke.

23 Le, oké ifufe nke Jehova, bú ọnuma-Ya, apuwo, ọ bu oké ifufe nke nēfechapu efechapu: n’isi ndi nēmebi iwu ka ọ gēfekwasi si-ike.

24 Iwe di ọku nke Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mesiri, ru kwa mb͕e O mesiri ka nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia ka unu gāghọta ya.