Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 11

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site n’aka Jehova, si,

2 Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu;

3 i gāsi kwa ha, Otúaka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Onye anābu ọnu ka onye ahu bu nke nādighi-anu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a,

4 nke M’nyere nna-unu-hà n’iwu n’ubọchi M’mere ka ha si n’ala Ijipt, si n’oké ọku ígwè ahu, puta, si, Genu nti olum, me ha, dika ihe nile si di nke M’nēnye unu n’iwu: unu ewe burum otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke:

5 ka M’we me ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M’ṅuru nna-unu-hà, inye ha ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya, dika o si di ta. M’we za, si, Amen, Jehova.

6 Jehova we sim, Kpọsa okwu ndia nile n’obodo nile nke Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem, si, Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha.

7 N’ihi na ab͕aworom nna-unu-ha àmà nke-uku n’ubọchi M’mere ka ha si n’ala Ijipt rigoputa, rue ta, nēbili n’isi-ututu nāb͕a àmà, si, Genu nti olum.

8 Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha n’ala, ha we jegharia, onye ọ bula n’isi-ike nke obi ọjọ ha: M’we me ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a biakwasi ha, bú nke M’nyere n’iwu ka ha me, ma ha emeghi ha.

9 Jehova we sim, Achọputawo nkekọta imegidem n’etiti ndi Juda, na n’etiti ndi bi na Jerusalem.

10 Ha alaghachikuruwo ajọ omume nile nke ndi bu nna-ochie-ha, ndi juru inu okwum nile; ha onwe-ha ejesowo kwa chi ọzọ di iche iche ifè ha òfùfè: ulo Israel na ulo Juda emebiwo ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara.

11 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M’gaje ime ka ihe ọjọ, nke ha nāpughi isi nime ya puta, biakute ha; ha gētikukwam, ma M’gaghi-ege ha nti.

12 Obodo nile nke Juda na ndi bi na Jerusalem gēje kwa tikuru chi nile nke ha onwe-ha nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: ma ọ dighi nzọputa ma-ọli ha gāzọputa ha na mb͕e ihe ọjọ ha.

13 N’ihi na ka ọnu-ọgugu obodo-gi ra, otú a ka chi-gi nile di, gi Juda; ka ọnu-ọgugu èzí Jerusalem ra kwa, otú a ka unu doworo ebe-ichu-àjà nye ihe-ihere ahu, bú ebe-ichu-àjà isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

14 Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha: n’ihi na M’gaghi-nānu olu-ha na mb͕e ha nākpokum n’ihi ihe ọjọ ha.

15 Gini ka nwayi nke ihe-ya nātọm utọ nke-uku nwere n’ulom, ebe ya na ọtutu madu meworo ajọ ihe-nzube, ọzọ, anu nsọ nēsi kwa n’aru gi gabiga? mb͕e i nēme ihe ọjọ, mb͕e ahu ka i nāṅuri ọṅu.

16 Osisi olive di ndu, nke mara nma n’imì nkpuru ọma, otú a ka Jehova kpọrọ aha-gi: n’olu nkpọtu uku ka O suyeworo ya ọku, alaka-ya nile anyakasiwo kwa.

17 N’ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye ahu nke kuworo gi n’ala, ekwuwo ihe ọjọ megide gi, n’ihi ihe ọjọ nke ulo Israel na ulo Juda, nke ha meworo onwe-ha n’ikpasum iwe n’isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

18 Jehova me-kwa-ram ka m’mara ya, m’we mara ya: mb͕e ahu ka I mere ka m’hu omume nile ha.

19 Ma mu onwem di ka nwa-aturu azùbiri azùbi nke anākpuru ije n’ob͕ub͕u-ya; ma amaghm na ọ bu mu ka ha zubereri nzube megide, si, Ka ayi bibie osisi na ihe-oriri-ya, ka ayi bipu kwa ya n’ala ndi di ndu, ka ewe ghara icheta kwa aha-ya ọzọ.

20 Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nēkpe ikpe n’ezi omume, Onye nānwa akuru na obi, kwe ka m’hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha: n’ihi na Gi ka m’kpugheworo okwu-ikpem.

21 N’ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi Anatot, bú ndi nāchọ ndu-gi, si, I gaghi-ebu amuma n’aha Jehova, ka i we ghara inwu site n’aka-ayi:

22 n’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a, Le, M’gaje iwere nmehie-ha leta ha: umu-okorọbia-ha gānwu site na mma-agha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gānwu site n’oké unwu;

23 ọ dighi kwa ndi fọduru ha gēnwe: n’ihi na M’gēme ka ihe ọjọ biakute ndi Anatot, n’arọ nleta-ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 12

1 Onye ezi omume ka I bu, Jehova, mb͕e mu na Gi nēkperita ikpe: ma otú ọ di, okwu ikpem nile ka m’gēkwu n’ebe I nọ: gini mere uzọ ndi nēmebi iwu ji agara ha nke-ọma? gini mere ndi nile nāghọb͕u nke-uku ji anọ n’udo?

2 I kuwo ha dika osisi, e, ha ab͕awo nkpọrọgwu; ha nētó, e, ha amiwo nkpuru: nso ka I nọ n’ọnu-ha, ma I nọ akuru-ha n’ebe di anya.

3 Ma Gi onwe-gi maram, Jehova; I nāhum, nwa kwa nkpuru-obim n’ebe I nọ: dọkpupu ha dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, do ha nsọ nye ubọchi ob͕ub͕u.

4 Rùe ole mb͕e ka ala gēru újú? rùe ole mb͕e ka ihe-ọkukú nke ubi nile gākpọnwu? site n’ihe ọjọ nke ndi bi nime ya ekpochapuwo anu-ulo nile na anu-ufe; n’ihi na ha siri, Ọ gaghi-ahu ikpe-azu-ayi.

5 Asi na i so ndi ji ukwu eje b͕a ọsọ, ha we me ka ike gwu gi, ì gēsi kwa aṅa nu ọku n’obi ib͕akari inyinya? ọ bu kwa n’ala udo ka i nọ na ntukwasi-obi, ma ì gēsi aṅa me na nbili-elu nke Jọdan?

6 N’ihi na ọbuná umu-nne-gi, na ulo nna-gi, ọbuná ha onwe-ha aghọb͕uwo gi; ọbuná ha onwe-ha akpọzuwo nkpu n’azu gi: ekwela ha, mb͕e ha gāgwa gi ezi ihe.

7 Arapuwom ulom, ajuwom ihe-nketam; ewerewom nwayi nke ihe-ya nātọ nkpuru-obim utọ nke-uku nye n’ọbu-aka ndi-iro-ya.

8 Ihe-nketam aghọworom ihe dika ọdum n’oké ọhia: o mewo ka olu-ya da megidem; n’ihi nka ka M’kpọworo ya asì.

9 Ọ̀ bu udele turu agwa ka ihe-nketam dirim? udele, hà nọ ya buruburu nēmegide ya? jenu, chikọta anu ọhia nile, me ka ha bia iri ihe.

10 Ọtutu ndi-ọzùzù-aturu ebibiwo ubi-vine nkem, ha azọdawo òkèm, ha emewo òkèm anāchọsi ike ka ọ ghọ ọzara tọb͕ọrọ n’efu.

11 O mewo ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu; o nēru újú n’ebe m’nọ, ebe ọ tọb͕ọrọ n’efu; ebe tọb͕ọrọ n’efu ka ala nka nile bu, n’ihi na ọ dighi onye ọ bula nētiye ya n’obi.

12 N’elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi nke di n’ọzara ka ndi nāpunara madu ihe biaworo: n’ihi na mma-agha Jehova nwere nēripia site n’otù nsọtu nke ala we rue nsọtu ọzọ nke ala: ọ dighi udo anu-aru ọ bula, bú madu, nwere.

13 Ha aghawo ọka wheat, ma ogwu bu ihe-ubi ha wereworo; ha aghọwo ndi-ọria, ma ọ dighi-abara ha urù: ka ihere ihe-omume nile unu me kwa unu, sita n’iwe di ọku nke Jehova.

14 Otú a ka Jehova kwuru megide ndi-ab͕ata-obi ọjọm nile, ndi nēmetu ihe-nketa ahu aka nke M’meworo ka ndim, bú Israel, keta: le, M’gaje iropu ha n’elu ala-ha, ulo Juda ka M’gēropu kwa n’etiti ha.

15 O gēru kwa, mb͕e M’ropusiri ha, na M’gēnwe kwa obi-ebere n’aru ha ọzọ; M’gēme kwa ka ha lata, onye ọ bula n’ihe-nketa-ya, na onye ọ bula n’ala-ya.

16 Ọ gēru kwa, ọ buru na ha amuta uzọ nile nke ndim nke-ọma, iji aham ṅu iyi, si, Jehova nādi ndu; dika ha zíri ndim iji Beal ṅu iyi; agēwuli kwa ha dika ulo n’etiti ndim.

17 Ma ọ buru na ha anughi, M’gēropu kwa mba ahu, nēropu ya nēme kwa ka ọ la n’iyì; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 13

1 Otú a ka Jehova sirim, Je, zutara onwe-gi ihe-ọkiké nke flax, tukwasi ya n’úkwù-gi, ma emela ka ọ ba na miri.

2 M’we zuta ihe-ọkiké dika okwu Jehova si di, m’we tukwasi ya n’úkwù.

3 Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si,

4 Were ihe-ọkiké ahu nke i zutaworo, nke di n’úkwù-gi, bilie, je Yufretis, zobe ya n’ebe ahu nime nb͕awa nke nkume di elu.

5 M’we je, zobe ya n’akuku Yufretis, dika Jehova nyerem iwu.

6 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na Jehova sirim, Bilie, je Yufretis, weputa ihe-ọkiké ahu n’ebe ahu, bú nke M’nyere gi iwu izobe n’ebe ahu.

7 M’we je Yufretis, gwue, weputa ihe-ọkiké ahu n’ebe m’zobere ya-ri: ma, le, ihe-ọkiké ahu ebibiwo, ọ bàghi n’ihe ọ bula.

8 Okwu Jehova we ruem nti, si,

9 Otú a ka Jehova siri, Otú a ka M’gēbibi npako Juda na npako bara uba nke Jerusalem.

10 Ndi ọjọ nka ndi nāju inu okwum nile, ndi nējeghari n’isi-ike nke obi-ha, we jeso chi di iche iche ọzọ ifè ha, na ikpọ isi ala nye ha, ndi nka gādi kwa ka ihe-ọkiké a, nke nādighi-abà n’ihe ọ bula.

11 N’ihi na dika ihe-ọkiké nārapara n’úkwù madu, otú a ka M’meworo ka ulo Israel nile na ulo Juda nile rapara n’arum, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); ka ha we ghọrọm otù ndi, na aha, na otuto, na ima-nma: ma ha anughi.

12 I gāgwa kwa ha okwu a, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Agāb͕aju ite ọ bula manya-vine: ha gāsi kwa gi, Ọ̀ bu na ayi amaghi na agāb͕aju ite ọ bula manya-vine?

13 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Le, M’gaje iwere nṅubiga-manya-ókè mejue ndi nile bi n’ala nka, bú ndi-eze ndi nānọchi Devid n’oche-eze-ya, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi nile bi na Jerusalem.

14 M’gātupia kwa ha, otù onye n’elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n’otù; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: M’gaghi-enwe ọmiko, M’gaghi-eme kwa ebere, M’gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M’we ghara ibibi ha.

15 Nurunu, ge kwa nti; unu adila elu n’obi: n’ihi na Jehova ekwuwo.

16 Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n’elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri.

17 Ma ọ buru na unu anughi ya, na nzuzo ka nkpuru-obim gākwa ákwá n’ihi npako-unu; anya-miri gāpu kwa n’anyam nke-uku, anya-miri ewe si n’anyam rùda, n’ihi na adọtara ìgwè aturu Jehova n’agha.

18 Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n’ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu.

19 Emechiwo obodo nile nke Negeb, ọ dighi kwa onye nēmeghe ha: emewo ka Juda je biri n’ala ọzọ, ha nile emezuwo ka ọ je biri n’ala ọzọ.

20 Welie anya-unu, hu ndi nēsi n’Ugwu bia: òle ebe ìgwè aturu enyere gi, bú ìgwè ewu na aturu-gi mara nma?

21 Gini ka i gāsi, mb͕e Ọ gēwere nmehie-gi leta gi, ebe gi onwe-gi zíworo ndi ahu imegide gi, bú ezi ndi-eyì-gi, ka ha buru ndi-isi-gi? ihe-nb͕u di iche iche, hà agaghi-ejidesi gi ike, dika nwanyi ime nēme?

22 Ma mb͕e i gāsi n’obi-gi, Gini mere ihe ndia ji dakwasim? n’ihi iba-uba nke ajọ omume-gi ka eji kpughe ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi, me ikiri-ukwu-gi abua ihe-ike.

23 Onye Etiopia, ọ̀ gāb͕anwe akpukpọ-aru-ya? ma-ọbu agu, ọ̀ gāb͕anwe agwa-ya? ọ buru otú a unu onwe-unu puru kwa ime ezi ihe, bú ndi emere ka unu muta ime ihe ọjọ.

24 M’gāchusa kwa ha, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke nāgabiga, nye ifufe ọzara.

25 Nka bu ihe efetara gi na nzà, òkè nke atùworo nye gi site nam, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); n’ihi na i chezọwo Mu onwem, we tukwasi okwu-ugha obi-gi.

26 Ya mere Mu onwem ji kpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi rue iru-gi, ewe hu nlelì-gi.

27 Ikwa-iko-gi nile, na ọbube-gi nile dika inyinya, nzube ọjọ nke ikwa-iko-gi, n’elu ugwu ntà nile n’ọhia, ahuwom ihe-árú-gi nile ndia. Ahuhu diri gi, Jerusalem! i gaghi-adi ọcha; #mb͕e ole gāgabiga tutu ọ di?

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 14

1 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia nti bayere okwu nb͕ochi miri-ozuzo.

2 Juda eruwo újú, ọnu-uzọ-ama-ya nile atalatawo kwa, ha yiri uwe-nkpe nọdu n’ala; iti-nkpu Jerusalem arigowo.

3 Ndi-ebube-ha ezigawo ndi-ntà-ha ichuta miri: ha abiaruwo olùlù-miri nile, ha achọtaghi miri; ha alatawo n’ite efu: ihere emewo ha, etiyewokwa ha n’ọnọdu-ihere, ha ekpuchiwo kwa isi-ha.

4 N’ihi ala nke b͕awara ab͕awa, n’ihi na oké miri-ozuzo adighi n’ala, ihere emewo ndi-ọlu-ubi, ha ekpuchiwo isi-ha.

5 N’ihi na ọbuná nne-ele amuwo nwa n’ọhia, we rapu ya, n’ihi na ahihia ndu adighi.

6 Inyinya-ibu-ọhia eguzowo kwa n’elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, ha ekubawo ifufe dika nkita-ọhia; anya-ha adalawo n’isi, n’ihi na ihe-ọkukú adighi.

7 Ọ bu ezie na ajọ omume-ayi azawo megide ayi, ma Gi lua olu n’ihi aha-Gi, Jehova: n’ihi na ndaghachi-azu-ayi di ọtutu; Gi ka ayi mehieworo megide.

8 Gi olile-anya Israel, onye-nzọputa-ya na mb͕e ahuhu, n’ìhi gini ka I di ka ọbìa n’ala nka, na dika onye-ije nke setiworo ulo-ikwū-ya inọ ọnọdu-abali?

9 N’ìhi gini ka I di ka onye ihe b͕agwojuworo anya, dika dike nāpughi izọputa? ma Gi onwe-gi nọ n’etiti ayi, Jehova, ọ bu kwa aha-Gi ka akpọkwasiworo ayi; arapula ayi.

10 Otú a ka Jehova siri ndi nka, Ọbuná otú a ka ha huworo nwaghari n’anya; ha eb͕ochighi ukwu-ha: ihe-ha atọghi kwa Jehova utọ; ub͕u a ka Ọ nēcheta ajọ omume-ha, were nmehie-ha leta ha.

11 Jehova we sim, Ekpela ekpere bayere ndi nka ichọ ọdi-nma-ha.

12 M’gbe ha nēbu ọnu, M’gaghi-nānu iti-nkpu-ha; ọzọ, mb͕e ha nēsure àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma, ihe-ha agaghi-nātọm utọ: kama mma-agha na oké unwu n’ajọ oria na-efe efe ka M’gaje iji me ka ha gwusia.

13 M’we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, ndi-amuma nāsi ha, Unu agaghi-ahu mma-agha, unu agaghi-enwe kwa oké unwu; kama udo nke ezi-okwu ka M’gēnye unu n’ebe a.

14 Jehova we sim, Amuma ugha ka ndi-amuma nēbu n’aham: eziteghm ha, enyekwaghm ha iwu, agwakwaghm ha okwu: amuma ọhù ugha, na nke iju arusi ase, na nke ihe-efu, na nke aghughọ nke obi-ha, ka ha nēburu unu.

15 N’ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ahu ndi nēbu amuma n’aha m, ma Mu onwem eziteghi ha, ma ha onwe-ha nāsi, Mma-agha na oké unwu agaghi-adi n’ala nka: Ọ si, Agēji mma-agha, ji kwa oké unwu, me ka ndi-amuma ahu gwusia.

16 Ọzọ, ndi ahu nke ha onwe-ha nēburu amuma gābu ndi anētufu n’èzí nile nke Jerusalem n’ihi oké unwu na mma-agha; ọ dighi kwa onye nēlì ozu ha gēnwe, ha onwe-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom: n’ihi na M’gāwukwasi ha ihe ọjọ ha.

17 I gāgwa kwa ha okwu a, si, Ka anya-miri si n’anyam erùda abali na ehihie, ka ha ghara kwa iguzo du; n’ihi na nb͕aji ukwu na aka di uku ka ejiworo b͕aji ada ndim nāmaghi nwoke, ọ bu ntiputa-ọnyá nke jọrọ njọ nke-uku.

18 Ọ buru na apuam je n’ọhia, le, ndi ejiworo mma-agha b͕u! ma ọ buru na abàm n’obodo a, le, ndi nāria ọria site n’oké unwu! n’ihi na ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà, ha akpaghariwo n’ala, ma ha amaghi ihe.

19 Ì jusiwo Juda? ọ̀ bu Zaion ka nkpuru-obi-Gi sọworo oyi? gini mere I ji tib͕u ayi, ma ọ dighi ọgwugwọ diri ayi? Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwo, ma, le, oké egwu!

20 Jehova, ayi mara nmebi-iwu-ayi, na ajọ omume nna-ayi-hà: n’ihi na ayi emehiewo megide Gi.

21 Elelìla ayi, n’ihi aha-Gi; akpọla oche-eze nke ebube-Gi ihe-nzuzu: cheta, emebila ọb͕ub͕a-ndu-Gi ayi na Gi b͕ara.

22 Ọ̀ di ihe ọ bula n’etiti ihe-efu nile nke mba nile nke nēme ka miri zo? ma-ọbu elu-igwe, hà gēnye oké miri-ozuzo? ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Onye ahu, Jehova, bú Chineke-ayi? ayi gēle kwa anya Gi; n’ihi na Gi onwe-gi emewo ihe ndia nile.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 15

1 Jehova we sim, Ọ buru na Moses na Samuel eguzo n’irum, nkpuru-obim agaghi-adi n’ebe ndi nka nọ: chupu ha n’irum, ka ha pu kwa.

2 O gēru kwa, mb͕e ha gāsi gi, Òle ebe ayi gāpu? i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ndi diri ọnwu gāpukuru ọnwu; ndi diri mma-agha gāpukuru mma-agha; ndi diri oké unwu gāpukuru oké unwu; ndi diri ndọta-n’agha gāpukuru ndọta-n’agha.

3 M’gēme kwa ka ab͕uru ihe anọ buru ndi-nlekọta-ha, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta): mma-agha ib͕u eb͕u, na nkita idọb͕u adọb͕u, na anu-ufe nke elu-igwe, na anumanu nke uwa, iripia na ibibi.

4 M’gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n’ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n’ihi ihe o mere na Jerusalem.

5 N’ihi na ònye gēnwe ọmiko n’aru gi, Jerusalem? ma-ọbu ònye gēgosi gi ebere o nwere n’aru gi? ma-ọbu ònye gēwezuga onwe-ya iju ajuju bayere udo-gi?

6 Gi onwe-gi arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), azu ka i nālaghachi: M’we setipu akam imegide gi, we bibie gi; ike ncheghari agwusiwom.

7 M’we were ihe-nfucha fucha ha n’ọnu-uzọ-ama nke ala nka; ab͕abawom ha aka umu, emewom ka ndim la n’iyì; ha esighi n’uzọ nile ha lata.

8 Ndinyom-ha di-ha nwuru ababigaworom uba ókè kari ájá nke oké osimiri nile: emewom ka onye nke nāpunara madu ihe biakute ha n’etiti-ehihie imegide nne nke umu-okorọbia: emewom ka nhuju-anya na obi-ọlulọ-miri dakwasi ya na mberede.

9 Nwayi nke muworo umu asa atalatawo; o kubìwo ume; anyanwu-ya adawo mb͕e ubọchi fọduru; ihere emewo ya, o we nwe iru-ihere: ọzọ, ndi-ha fọduru, ọ bu n’aka mma-agha ka M’gēnye ha n’iru ndi-iro-ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

10 Ahuhu dirim, nnem, na i muwom onye-ọ̀gù na onye-esem-okwu n’ebe uwa nile di! ebinyeghm ego n’uma; madu ebinyeghkwam ego n’uma; ma onye ọ bula nime ha nākọcham.

11 Jehova siri, N’ezie atọpuwom i ime ezi ihe; n’ezie emewom ka onye-iro-gi riọ gi aririọ na mb͕e ihe ọjọ na nime mb͕e nkpab͕u.

12 Àgētiji ígwè si n’Ugwu puta, na ọla?

13 Ume-gi na àkù-gi nile ka M’gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n’agha, ọ bughi n’ihi ọnu-ahia, ma n’ihi nmehie-gi nile, ọbuná n’ókè-ala-gi nile.

14 M’gēme kwa ka ha soro ndi-iro-gi gabiga n’ala i nāmagh: n’ihi na amuyewo ọku n’iwem, n’aru unu ka ọ gēre.

15 Gi mara, Jehova: chetam, letakwam, we bọ̀rọm ndi nēsob͕um ọ́bọ̀; ewepulam n’eweghi-iwe-ọsọsọ nke Gi: mara na eburuwom ita-uta n’ihi Gi.

16 Achọputawo okwu-Gi, m’we rie ha; okwu-Gi we ghọrọm ihe-obi-utọ na ọṅù obim: n’ihi na akpọkwasiwom aha-Gi, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha.

17 Anọdughm ala n’ìzù nzuzo nke ndi nāchì ọchì nke-uku, aṅurighkwam ọṅu: n’ihi aka-Gi náním otú nọduru ala; n’ihi na oké iwe ka I jiworo mejuem.

18 N’ìhi gini ka ihe-nb͕um digidere mb͕e nile? n’ìhi gini ka ntiputa-ọnyám nādighi ngwọta? ọ juwo ka agwọta ya. Ì gāburum nání ihe di ka miri-iyi nārafu arafu, dika miri na-ekwesighi ntukwasi-obi?

19 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a, Ọ buru na i lata, M’gēme kwa ka i lata, n’irum ka i gēguzo; ọ buru na i me ka ihe di oké ọnu-ahia si n’ihe jọb͕uru onwe-ya puta, dika ọnum ka i gābu: ndi ahu gālaghachikute gi, ma gi onwe-gi agaghi-alaghachikute ha.

20 M’gēme kwa gi ka i ghọrọ ndi nka mb͕idi ọla ewusiri ike; ha gēbuso kwa gi agha, ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n’ihi na gi ka M’nọyere izọputa gi na inaputa gi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

21 M’gānaputa kwa gi n’aka ndi ọjọ, b͕aputa gi n’aka ndi nēme ka madu ma jijiji.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 16

1 Okwu Jehova we ruem nti, si

2 I gaghi-alutara onwe-gi nwunye, i gaghi-enwe kwa umu-ndikom na umu-ndinyom n’ebe a.

3 N’ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere umu-ndikom baye-kwa-ra umu-ndinyom, ndi amuru n’ebe a, baye-kwa-ra nne-ha ndi muru ha, baye-kwa-ra nna-ha ndi muru ha n’ala nka, si,

4 Site n’ọnwu nke ọria di iche iche ka ha gānwu; agaghi-etiri ha aka n’obi, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n’elu ala ka ha gāghọ: ha gēsite kwa na mma-agha, site kwa n’oké unwu, gwusia; ozu-ha gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri.

5 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Abala n’ulo nke ikwa-ozu, eje-kwa-la iti aka n’obi, egosi-kwa-la ha ebere i nwere n’aru ha: n’ihi na ewepuwom udom n’ebe ndi nka nọ, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), bú ebere na obi-ebere nile.

6 Ha gānwu kwa, ma ndi uku ma ndi ntà, n’ala nka: agaghi-elì ha, madu agaghi-eti-kwa-ra ha aka n’obi, madu agaghi-ebì kwa onwe-ya mma, ọ gaghi-eme-kwa-ra ha isi-nkwọcha:

7 agaghi-ekesara ha nri n’iru-újú, ikasi madu obi bayere onye nwuru anwu; agaghi-eme kwa ka ha ṅua iko nkasi-obi bayere nna madu ma-ọbu bayere nne madu.

8 Ọzọ, n’ulo nke oké oriri ka i nāgaghi-abà inọyere ha iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu.

9 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M’gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n’ebe a n’anya-unu na n’ubọchi-unu.

10 O gēru kwa, mb͕e i gēgosi ndi nka okwu ndia nile, ha ewe si gi, N’ìhi gini ka Jehova kwuworo ihe ọjọ uku a nile megide ayi? ma-ọbu gini bu ajọ omume-ayi? ma-ọbu gini bu nmehie-ayi nke ayi mehieworo megide Jehova, bú Chineke-ayi?

11 I gāsi kwa ha, N’ihi na nna-unu-hà arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ha we jeso chi ọzọ di iche iche, fè ha, kpọ isi ala nye ha, ma Mu ka ha rapuru, ọ bu kwa iwum ka ha nēdebeghi;

12 unu onwe-unu emewo kwa ihe ọjọ kari nna-unu-hà; n’ihi na, le, unu nējeso, onye ọ bula isi-ike nke obi ọjọ ya unu we ghara igem nti:

13 M’gātupu kwa unu n’elu ala nka tukwasi unu n’ala ahu nke unu nāmaghi, ma ọ bu unu onwe-unu ma -ọbu nna-unu-hà; unu gēfè kwa chi ọzọ di iche iche n’ebe ahu ehihie na abali; n’ihi na M’gaghi-emere unu amara.

14 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na agaghi-asi kwa ọzọ, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n’ala Ijipt rigoputa;

15 kama agāsi, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n’ala Ugwu na n’ala nile ebe Ọ chusara ha-ri rigoputa: M’gēme kwa ka ha lata n’ala ahu nke M’nyere ndi bu nna-ha.

16 Le, M’gaje iziga kpọ ọtutu ndi-ọ́kù, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ha gākùru ha; emesia M’gēziga kpọ ọtutu ndi-ntá, gēsi n’elu ugwu ọ bula, na n’elu ugwu ntà ọ bula, na nime nb͕awa nkume nile di elu, chu ntá ha.

17 N’ihi na anyam abua dikwasi n’uzọ nile ha: ezopughi ha n’irum, ezobeghi kwa ajọ omume-ha pua n’iru anyam abua.

18 Ma M’gēburu uzọ kwughachi ajọ omume-ha na nmehie-ha okpukpu abua; n’ihi na ha emewo alam ka ọ ghara idi nsọ n’ozu nke nile ha nke nāsọ oyi, ọ bu kwa ihe-árú nile ha ka ha ji kpojue ihe-nketam.

19 Jehova, ikem, na ebem siri ike, na ebe-nb͕abàm n’ubọchi nkapab͕u, Gi ka mba nile gābiakute site na nsọtu nile nke uwa, si, Nání okwu-agha ka nna-ayi-hà ketaworo, bú ihe-efu na ihe nke ọ nadighi urù ha bara.

20 Madu, ọ̀ gēmere onwe-ya chi di iche iche, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi?

21 N’ihi nka, le, M’gaje ime ka ha mara, na mb͕e a ka M’gēme ka ha mara akam na idi-ikem; ha gāmara kwa na aham bu Jehova.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 17

1 Ejiwo pen ígwè, ji kwa ọnu-ọnu diamond, de nmehie Juda: atuwo ya n’elu mbadamba nkume, bú obi-ha, na n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nile nke umu;

2 ebe umu-ha nēcheta ebe-ichu-aja nile ha na Asherim-ha n’akuku osisi ndu n’elu ugwu ntà ha nile di elu.

3 Gi ugwum nke di n’ọhia, ume-gi na àkù-gi nile ka M’gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n’agha, M’gēnye kwa ebe-gi nile di elu, n’ihi nmehie, n’ókè-ala-gi nile.

4 I gārapu kwa, ọbuná site n’onwe-gi, ihe-nketa-gi nke M’nyere gi; M’gēme kwa ka i fè ndi-iro-gi n’ala ahu nke i nāmagh: n’ihi na ọku ka unu muyeworo n’iwem, rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ gēre.

5 Otú a ka Jehova siri: Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-aru, bú madu, buru ogwe-aka-ya, onye obi-ya nēsi kwa n’ebe Jehova nọ wezuga onwe-ya.

6 Ọ gādi kwa ka osisi tamarisk n’ala ihe nādighi, ọ gaghi-ahu kwa mb͕e ọdi-nma nābia; ma ọ gēbi n’ebe nile kpọrọ nku n’ọzara, bú ala nnú ebe madu nēbighi.

7 Onye agọziri agọzi ka nwoke ahu bu nke nātukwasi Jehova obi, onye Jehova bu ihe-ntukwasi-obi-ya.

8 Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n’akuku miri, ọ bu kwa n’akuku osimiri ka ọ nāwasa nkpọrọgwu-ya, ọ dighi-atu kwa egwu mb͕e okpom-ọku nābia, ma akwukwọ-ya gābu akwukwọ ndu; ọzọ, n’arọ nb͕ochi miri-ozuzo ọ gaghi-echeb͕u onwe-ya, ọ gaghi-apu kwa n’imì nkpuru.

9 Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?

10 Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di.

11 Dika ọkwa nke nēkpokọba umu nke ọ nāmughi, otú a ka onye nākpa àkù, ma ọ kpaghi ya n’ikpé ziri ezi, si di; n’etiti ubọchi ndu-ya ọ gārapu ya, n’ikpe-azu-ya o we buru onye-nzuzu.

12 Oche-eze nke di ebube, nke di n’elu site na mbu, ọnọdu nke ebe nsọ ayi,

13 olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n’ebe M’nọ wezuga onwe-ha, n’ala ka agēde ha, n’ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova.

14 Me ka m’diri ndu, Jehova, m’we diri ndu; zọputam, ewe zọputam: n’ihi otutom ka I bu.

15 Le, ndi ahu nāsim, Òle ebe okwu Jehova di? biko, ya bia.

16 Ma mu onwem, anukpọghm ipu n’iso Gi n’izù aturu; ọzọ, ubọchi nādighi ngwọta, achọsighm ya ike; Gi onwe-gi mara: ihe si n’eb͕ub͕ere-ọnum puta, na ncherita-iru Gi ka ọ diworo.

17 Aghọlam ihe-ujọ: ebe-nb͕abàm ka I bu n’ubọchi ihe ọjọ.

18 Ka ihere me ndi nēsob͕um, ma ka ihere ghara ime mu onwem; ka ndi ahu tua ujọ, ma ka mu onwem ghara itu ujọ: me ka ubọchi ihe ọjọ biakwasi ha, were kwa okpukpu ntipia abua tipia ha.

19 Otú a ka Jehova sirim: Je, guzo n’ọnu-uzọ-ama nke umu ndim, nke ndi-eze Juda nēsi abata, nke ha nēsi apu kwa, guzo kwa n’ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem;

20 si ha, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na Juda nile na ndi nile bi na Jerusalem, bú ndi nābata n’ọnu-uzọ-ama ndia:

21 otú a ka Jehova siri: Lezienu onwe-unu anya, unu ebu-kwa-la ibu n’ubọchi-izu-ike, unu ebubà-kwa-la ya n’ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem;

22 unu agaghi-ebupu kwa ibu n’ulo-unu n’ubọchi-izu-ike, ọ bu kwa ozi ọ bula ka unu nāgaghi-eje: ma donu ubọchi-izu-ike nsọ, dika M’nyere nna-unu-hà iwu;

23 ma ha anughi, ha atọghi kwa nti-ha n’ala, ha we kwesie olu-ha ike, ka ha we ghara inu, ghara kwa inara idọ-aka-na-nti.

24 O gēru kwa, ọ buru na unu egem nti nke-ọma, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ighara ibubata ibu n’ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a n’ubọchi-izu-ike, kama ya ido ubọchi-izu-ike nsọ, ighara ije ozi ọ bula nime ya;

25 ndi-eze na ndi-isi, ndi nānọkwasi n’oche-eze Devid, gābata kwa n’ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a, bú ndi nānọkwasi n’ub͕ọ-ala na n’inyinya, ha onwe-ha, na ndi-isi-ha, ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem: obodo a gānọgide kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

26 Ha gēsi kwa n’obodo nile nke Juda, si kwa n’ebe nile di Jerusalem buruburu, si kwa n’ala Benjamin, si kwa n’ebe di ala ala, si kwa n’ugwu, si kwa na Negeb, bia, nēwebata ihe àjà-nsure-ọku, na àjà ọzọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, nēwebata kwa ekele, n’ulo Jehova.

27 Ma ọ buru na unu egeghm nti ido ubọchi-izu-ike nsọ, na ighara ibū ibu bata n’ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem n’ubọchi-izu-ike; M’gēsuye kwa ọku n’ọnu-uzọ-ama-ya nile, ọ gērichapu kwa ulo-elu nile nke Jerusalem, agaghi-emenyu kwa ya.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 18

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2 Bilie, rida n’ulo ọkpu-ite, ọ bu kwa n’ebe ahu ka M’gēme ka i nu okwum.

3 M’we rida n’ulo ọkpu-ite, ma, le, ọ nēje ozi-ya n’elu wheel-ya abua.

4 Ewe bibie ihe onye ahu ji urọ akpu n’aka ọkpu-ite ahu, o we kpu kwa ya ọzọ ihe di iche, dika o ziri ezi n’anya ọkpu-ite ahu ikpu ya.

5 Okwu Jehova we ruem nti, si,

6 Àpughm ime unu dika ọkpu-ite a mere, unu ulo Israel? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta. Le, dika urọ si di n’aka ọkpu-ite a, otú a ka unu onwe-unu di n’akam, unu ulo Israel.

7 N’otù ntabi-anya ahu mb͕e M’nēkwu okwu bayere mba ọ bula, iropu ya na ikwada ya na ime ka ọ la n’iyì;

8 ọ buru na mba ahu nke M’kwuworo okwu bayere ya esi n’ihe ọjọ ya chigharia, M’gēchèghari kwa n’ihe ọjọ ahu nke M’chère ime ya.

9 Ọzọ, n’otù ntabi-anya ahu mb͕e M’nēkwu okwu bayere mba ọ bula, baye-kwa-ra ala-eze ọ bula, iwu ya dika ulo na iku ya dika osisi;

10 ọ buru na o me ihe jọrọ njọ n’anyam, we ghara ige nti n’olum, M’gēchèghari kwa n’ezi ihe ahu, nke M’siri na M’gēji me ya nma.

11 Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n’uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma.

12 Ma ha siri, Ntukwasi-obi adigh: n’ihi na èchìchè nile nke ayi ka ayi nējeso, ayi nēme kwa, onye ọ bula ihe isi-ike nke obi ọjọ ya.

13 N’ihi nka ka Jehova ji si otú a: Biko, juanu n’etiti mba nile, si, Ònye nuworo ihe di ka ndia? ihe jọb͕uru onwe-ya nke-uku ka nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke meworo.

14 Snow nke Lebanon, ọ̀ gārapu oké nkume nke ọhia? ma-ọbu miri oyi nke si n’ala ọzọ erù, ọ̀ gātada?

15 N’ihi na ndim echezọwom, ihe-efu ka ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye; ha we me ka ha su ngọngọ n’uzọ nile ha, bú uzọ-ije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, ije ije n’okporo-uzọ di iche iche, bú uzọ anātulighi atuli;

16 ime ka ala-ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ mb͕e ebighi-ebi; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n’akuku ya anya, o gēfufe kwa isi-ya.

17 Dika ifufe Iru-anyanwu ka M’gāchusa ha n’iru onye-iro; azu, ọ bughi iru, ka M’gēme ka hu ha n’ubọchi nhuju-anya-ha.

18 Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n’ihi na iwu agaghi-esi n’ebe onye-nchu-àjà nọ la n’iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n’ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n’ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n’okwu-ya nile.

19 Ṅam nti, Jehova, ge kwa nti olu ndi nālusom ọ̀gù.

20 Àgākwughachi ihe ọjọ n’ọnọdu ezi ihe? n’ihi na ha egwuworo nkpuru-obim olùlù. Cheta nguzo m’guzoro n’iru Gi ikwu ezi ihe bayere ha, ime ka ọnuma-Gi si n’aru ha laghachi.

21 N’ihi nka were umu-ha nye oké unwu, rara kwa ha nye n’aka mma-agha; ka ndinyom-ha ghọ kwa ndi b͕ara aka nwa na ndi di-ha nwuru; ka ndikom-ha ghọ kwa ndi ọnwu b͕uru, ka umu-okorọbia-ha ghọ ndi etib͕uru na mma-agha n’agha.

22 Ka anuru iti-nkpu nke gēsite n’ulo nile ha, mb͕e I gēme ka usu ndi nāpunara madu ihe biakwasi ha na mberebe: n’ihi na ha egwuwo olùlù inwudem, ha ezobewo-kwa-ra ukwum abua ib͕udu di iche iche.

23 Ma Gi onwe-gi, Jehova, amawo ndum-ọdu nile ha imegidem ime ka m’nwua; ekpuchila ajọ omume-ha, ehichapu-kwa-la nmehie-ha n’iru Gi: ma ka ha ghọ ndi emeworo ka ha su ngọngọ n’iru Gi; meso ha na mb͕e iwe-Gi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 19

1 Otú a ka Jehova siri, Je, zuta karama nke ọkpu-ite ji urọ akpu, chiri kwa ufọdu nime ndi-okenye ndim, na nime ndi-okenye ndi-nchu-àjà;

2 purue ndagwurugwu nwa Hinom, nke di n’oghere ọnu-uzọ-ama ejùjù, kpọsa n’ebe ahu okwu nile nke M’gāgwa gi:

3 si, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na ndi bi na Jerusalem; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M’gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.

4 N’ihi na ha arapuwom, we ghara imata ebe a, we surere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ nime ya, bú ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha na ndi bu nna-ha na ndi-eze Juda; ha emejuwo kwa ebe a n’ọbara ndi nēmeghi ihe ọjọ;

5 ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Beal, isure umu-ha ndikom n’ọku ka ha buru àjà-nsure-ọku anāchuru Beal; nke M’nēnyeghi n’iwu, ekwughkwam ya, ọ bataghi kwa n’obim:

6 n’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ebe a Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u.

7 M’gāwusi kwa ndum-ọdu Juda na Jerusalem n’ebe a dika miri; M’gēme kwa ka ha da site na mma-agha n’iru ndi-iro-ha, na site n’aka ndi nāchọ ndu-ha: M’gēnye kwa ozu-ha iburu anu-ufe nke elu-igwe, na iburu anumanu nke uwa, ihe-oriri.

8 M’gēme kwa ka obodo a ghọ ihe-iju-anya, ka ọ ghọ kwa ihe-ima-ọsọ; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n’akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n’ihi ihe-otiti-ya nile.

9 M’gēme kwa ka ha rie anu-aru nke umu-ha ndikom na anu-aru umu-ha ndinyom, ha gēri kwa, onye ọ bula anu-aru ibe-ya, nime nnọchigide-n’agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-ha na ndi nāchọ ndu-ha nākpab͕u ha.

10 I gētiwa kwa karama ahu n’anya ndikom ahu, bú ndi nēso gi je,

11 i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọbuna otú a ka M’gētiwa ndi nka na obodo a, dika madu si etiwa ite ọkpu-ite, nke anāpughi imezi kwa ya ọzọ: ọ bu kwa na Tofet ka ha gēlì ozu, n’ihi na ebe ilì ozu adighi.

12 Otú a ka M’gēme ebe a, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), me kwa ndi bi ya, ọbuná ime obodo a ka ọ di ka Tofet:

13 ulo nile nke Jerusalem na ulo nile ndi-eze Juda, nke ruru árú, gādi kwa ka ebe Tofet, bú ulo nile nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì uto n’elu-ha nye usu nile nke ihe elu-igwe, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu.

14 Jeremaia we si na Tofet bia, ebe Jehova zigara ya ibu amuma; o we guzo n’ogige ulo Jehova, si ndi Israel nile:

15 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M’gaje ime ka ihe ọjọ a nile biakwasi obodo a, biakwasi kwa obodo-ya nile, bú nke M’kwuworo megide ya; n’ihi na ha ekwesiwo olu-ha ike, ka ha ghara inu okwum nile.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 20

1 Pashua nwa Imea, bú onye-nchu-àjà, nke bu kwa onye-nlekọta, onye-ndú n’ulo Jehova, Pashua ahu we nu ka Jeremaia nēbu amuma okwu ndia.

2 Pashua we tie Jeremaia, bú onye-amuma, ihe, tiye ya n’ọtọsi ahu nke di n’ọnu-uzọ-ama Benjamin di n’elu, nke di n’ulo Jehova.

3 O rue n’echi-ya, na Pashua mere ka Jeremaia si n’ọtọsi ahu puta. Jeremaia we si ya, Ọ dughi Pashua ka Jehova kpọworo aha-gi, kama ọ bu Megoa-misabibi.

4 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M’gaje ime gi ka i ghọrọ onwe-gi, ghọ-kwa-ra ndi nile nāhu gi n’anya, ihe-ujọ: ha gāda kwa site na mma-agha ndi-iro-ha, anya-gi abua ganāhu kwa ya: ọ bu kwa Juda nile ka M’gēnye n’aka eze Babilon, ọ gēme kwa ka ha je biri na Babilon, ọ gēji kwa mma-agha tib͕ue ha.

5 M’gēnye kwa ihe nile akpakọbara n’obodo a, na ihe nile putara na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu, na ihe-ya nile nke di oké ọnu-ahia, e, àkù nile nke ndi-eze Juda ka M’gēnye n’aka ndi-iro-ha, ndi gāluta ihe-ha n’agha, chiri ha, chibà ha na Babilon.

6 Gi onwe-gi kwa, Pashua, na ndi nile bi n’ulo-gi gēje na ndọta-n’agha: ọ bu kwa Babilon ka i gābata, ọ bu kwa n’ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n’ebe ahu ka agēlì gi, gi onwe-gi, na ndi nile nāhu gi n’anya, ndi i buworo amuma ugha.

7 I ràwom urà, Jehova, ewe ràram: I jidewom, we nwe ike karim: aghọwom ihe-ichì-ọchì ogologo ubọchi nile, madu nile ọ bula nākwam emò.

8 N’ihi na mb͕e ọ bula m’nēkwu, etim nkpu; Ihe-ike na Ipunara-madu-ihe, ka m’nākpọ nkpu: n’ihi na okwu Jehova ghọrọm ihe-ita-uta na ihe-ikwa-emò ogologo ubọchi nile.

9 M’we si, M’gaghi-ehota Ya, m’gaghi-ekwu kwa okwu ọzọ n’aha-Ya. O we di n’obim dika ọku nēre ere nke emechibidoro n’ọkpukpum nile, ike gwu-kwa-ram inagide ya, enweghkwam ike.

10 N’ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, ujọ dim buruburu. Gosinu, ayi gēgosi kwa ya, ka ha nāsi, bú ndi nile mu na ha di n’udo, ndi nēche nche n’akukum; eleghi anya agāràra ya, ayi ewe nwe ike imegide ya, bọ̀ọ ọ́bọ̀-ayi n’aru ya.

11 Ma Jehova nọyerem dika dike nke nēme ka ama jijiji: n’ihi nka ndi nēsob͕um gāsu ngọngọ, ha agaghi-enwe kwa ike: ihere gēme ha nke-uku, n’ihi na ha enweghi uche, agaghi-echezọ ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi nke etiyere ha.

12 Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nānwa onye ezi omume, Onye nāhu akuru na obi, ka m’hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha; n’ihi na Gi ka m’kpugheworo okwu-ikpém.

13 Bùkuenu Jehova abù, tonu Jehova: n’ihi na Ọ naputawo nkpuru-obi nke ob͕eye n’aka ndi nēme ihe ọjọ.

14 Ihe anābu ọnu ka ubọchi ahu bu nke amurum nime ya: ubọchi nke nnem murum, ya ghara ibu nke agọziri agọzi.

15 Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke ziri nnam ozi, si, Amutara gi nwa-nwoke; nēme ka ọ ṅuria ọṅu nke-uku.

16 Ka nwoke ahu di kwa ka obodo nile nke Jehova kwaturu, ghara ichèghari: ya nu kwa iti-nkpu n’ututu, na iti-nkpu agha n’etiti-ehihie;

17 n’ihi na o meghi ka m’nwua site n’afọ nnem; nnem ewe ghọrọm ílì, afọ-ya anēburum mb͕e ebighi-ebi.

18 N’ìhi gini kwa ka m’siri n’afọ nnem puta ihu ọnọdu ọjọ na nwuta, ewe ji ihere me ka ubọchim nile gwusia?