Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 1

1 Okwu Jeremaia nwa Hilkaia, onye sitere na ndi-nchu-àjà ndi nọ n’Anatot n’ala Benjamim:

2 onye okwu Jehova ruru nti n’ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda, n’arọ nke-iri-na-atọ ọ bu eze.

3 O ru-kwa-ra ya nti n’ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, rue mb͕e arọ nke-iri-na-otù nke Zedekaia nwa Josaia, bú eze Juda, gwusiri: rue mb͕e emere ka Jerusalem je biri n’ala ọzọ n’ọnwa nke-ise.

4 Okwu Jehova we ruem nti, si,

5 Tutu akpua m gi n’afọ amaram gi, ọ bu kwa tutu i si n’àkpà-nwa puta ka M’doro gi nsọ; ewerewom gi nye ka gi buru onye-amuma diri mba nile.

6 M we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, amaghm ikwu okwu, n’ihi na nwata ka m’bu.

7 Jehova we sim, Asila, Nwata ka m’bu: n’ihi na ọ bu onye ọ bula M’gēzì gi ka i gējekuru, ọ bu kwa ihe ọ bula M’genye gi n’iwu ka i gēkwu.

8 Atula egwu iru-ha: n’ihi na gi ka M’nọyere inaputa gi, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

9 Jehova we setipu aka-Ya, me ka o rutu ọnum: Jehova we sim, Le, etinyewom okwum nile n’ọnu-gi:

10 le, emewom gi ta ka i lekọta mba nile, lekọta kwa ala-eze nile, iropu, na ikwada, na ime ka ha la n’iyì, na itikpọ, na iwu ulo, na iku ihe.

11 Okwu Jehova we ruem nti, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Jeremaia? M’we si, Nkpa-n’aka nke osisi almond ka m’nāhu.

12 Jehova we sim, I huwo nke-ọma: n’ihi na onye nāmu anya ka M’bu n’ebe okwum di ime ya.

13 Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M’we si, Ite afunwuworo ọku n’okpuru ya ka m’nāhu; iru-ya site-kwa-ra n’Ugwu.

14 Jehova we sim, N’Ugwu ka agēsi tọpu ihe ọjọ idakwasi ndi nile bi n’ala nka.

15 N’ihi na, le, M’gaje ikpọ ab͕uru nile nke ala-eze nile nke Ugwu òkù, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta; ha gābia kwa, do, onye ọ bula oche-eze-ya, n’oghere ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem, na imegide mb͕idi-ya nile buruburu, na imegide obodo nile nke Juda.

16 M’gēkwu kwa okwu ikpem nile n’ebe ha nọ bayere ihe ọjọ ha nile; n’ihi na ha arapuwom, we surere chi ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, kpọ kwa isi ala nye ọlu di iche iche nke aka-ha.

17 Ma gi onwe-gi, ke ihe-ọkiké n’úkwù-gi, bilie, gwa ha ihe nile Mu onwem nēnye gi n’iwu: atula ujọ ha, ka M’we ghara ime ka i tu ujọ n’iru ha.

18 Ma Mu onwem, le, ewerewom i nye ta ibu obodo ewusiri ike, na ibu ide ígwè, na ibu mb͕idi ọla, imegide ala nka nile, imegide eze nile nke Juda, imegide ndi-isi-ya, imegide ndi-nchu-àjà-ya, na imegide ndi ala ahu.

19 Ha gēbuso kwa gi agha; ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n’ihi na gi ka M’nọyere, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), inaputa gi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 2

1 Okwu Jehova we ruem nti, si,

2 Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n’ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n’anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n’ọzara, n’ala anāghaghi nkpuru.

3 Israel bu ihe nsọ Jehova nwere, nkpuru mbu nke ihe-ọmume-Ya: ikpe gāma ndi nile nke nēripia ya; ihe ọjọ gābiakwasi ha, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

4 Nurunu okwu Jehova, unu ulo Jekob, na ab͕uru nile nke ulo Israel:

5 otú a ka Jehova siri, Àjọ omume gini ka nna-unu-hà huworo n’arum, na ha esiwo n’ebe M’nọ je n’ebe di anya, we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu?

6 Ha asighi kwa, Òle ebe Jehova nọ, bú Onye meworo ka ayi si n’ala Ijipt rigoputa; Onye meworo ka ayi je ije n’ọzara, n’ala nke ebe ihe nādighi na nke olùlù, n’ala ọkpọ-nku na nke onyinyo ọnwu, n’ala nke ọ nādighi onye gabigara nime ya, na nke madu nēbighi n’ebe ahu?

7 M’we me ka unu bata n’ala nke ubi ọma, iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya: unu we bata, we merua alam, me ka ihe-nketam ghọ ihe-árú.

8 Ndi-nchu-àjà asighi, Òle ebe Jehova nọ? ọzọ, ndi ji iwum eme ihe amaghm: ndi-ọzùzù-aturu jehie-kwa-ra megidem, ndi-amuma ji-kwa-ra Beal bu amuma, ọ bu kwa ihe nādighi-abà urù ka ha jesoro.

9 N’ihi ya Mu na unu gēkpe kwa ikpe ọzọ, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), Mu na umu umu-unu gēkpe kwa ikpe.

10 N’ihi na, gabiganu rue agwe-etiti nile nke Kitim, we hu; ziga-kwa-nu na Kida, we chigharia uche nke-uku; hu-kwa-nu ma ihe di otù a adiwo.

11 Ọ̀ di mba ab͕anweworo chi di iche iche ha, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi? ma ndim ab͕anwewo nsọpuru-ha n’ihe nadighi-abà urù.

12 Ka ibodo ihe a nwu a unu n’aru, unu elu-igwe, tuanu oké ujọ, burunu ihe tọb͕ọrọ n’efu nke-uku, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

13 N’ihi na ihe ọjọ abua ka ndim meworo; Mu ka ha rapuworo, bú isi-iyi nke miri nēnye ndu, ka ha we gwuwara onwe-ha olùlù-miri di iche iche, bú olùlù-miri tipúru etipú, nke nānagideghi miri.

14 Israel, ọ̀ bu orù? ọ̀ bu orù amuru n’ulo ka ọ bu? gini mere o ji ghọ ihe-nluta-n’agha?

15 Ya ka umu-ọdum nāb͕o uja, ha ewewo ka olu-ha da udà: ha we me ka ala-ya ghọ ebe tọbọrọ n’efu; esuresiwo obodo-ya nile oku, ha we ghara inwe onye-obibi.

16 Ọzọ, umu Nof na Tahpanhes nērichapu opu-n’isi-gi.

17 Ọ̀ bughi nka ka i nēmere onwe-gi, n’irapu Jehova, bú Chineke-gi, mb͕e Ọ nēme ka i je ije n’uzọ?

18 Ma ub͕u a gini ka i nwere n’uzọ Ijipt, n’iṅu miri Shaihoa? ma-ọbu gini ka i nwere n’uzọ Asiria, n’iṅu miri nke Osimiri ahu?

19 Ihe ọjọ gi gādọ gi aka na nti, ndaghachi-azu-gi nile gāba-kwa-ra gi nba: ya mere mara, hu na ihe ọjọ na ihe di ilu ka ọ bu, na i rapuworo Jehova, bú Chineke-gi, oké egwum we ghara idi n’aru gi, ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

20 N’ihi na site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka M’b͕ajiworo yoke-gi, tijie ab͕u-gi nile; i we si, M’gaghi-efè òfùfè; n’ihi na n’elu ugwu ntà ọ bula di elu nan’okpuru osisi ndu ọ bula ka gi onwe-gi nērulata onwe-gi, nākwa iko.

21 Ma Mu onwem kuru gi-ri osisi vine kachasi nma, nkpuru nke bu nání ihe ziri ezi: ì si kwa aṅa b͕anwe orù osisi vine nke ala ọzọ n’ebe M’nọ?

22 N’ihi na ọ buru na i ji akanwu sa aru, i were kwa n’onwe-gi ọtutu nchà, ma akaworo ajọ omume-gi n’irum, ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

23 Ì gēsi aṅa si, Arughm árú, ejesoghm Bealim? le uzọ-gi na ndagwurugwu, mara ihe i meworo: i bu nwa-ab͕ọghọ-camel di nkọ nāb͕aghari n’uzọ-ya nile;

24 i bu nne-inyinya-ibu-ọhia nke mara ọzara aka; n’ọchichọ nke nkpuru-obi-ya o kubawo ifufe; na mb͕e ọbub͕a-ya ònye gēme ka ọ laghachi azu? ndi nile nke nāchọ ya agaghi-ada #mbà; n’ọnwa-ya ka ha gāchọta ya.

25 B͕ochie ukwu-gi n’ibà ukwu efu, b͕ochi kwa akpiri-gi n’ikpọ-nku: ma i siri, Ntukwasi-obi adigh: é-è; n’ihi na ahuwom ndi ala ọzọ n’anya, ha ka m’gējeso kwa.

26 Dika ihere onye-ori mb͕e anāchọputa ya, otú a ka emeworo ka ihere me ulo Israel; ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-aja-ha, na ndi-amuma-ha;

27 ndi nāsi osisi, Nnam ka i bu; nāsi kwa nkume, Gi onwe-gi murum: n’ihi na ha ab͕akutawom azu, ha echeghm iru: ma na mb͕e ọnọdu ọjọ ha ha gasi, Bilie, we zọputa ayi.

28 Ma òle ebe chi-gi nile nke i meworo nye onwe-gi nọ? ka ha bilie, ọ buru na ha gāzọputa gi na mb͕e ọnọdu ọjọ gi: n’ihi na dika ọnu-ọgugu obodo-gi nile si di, otú a ka chi-gi nile di, Juda.

29 N’ìhi gini ka unu nārusom uka? unu nile ejehiewo megidem, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

30 N’efu ka M’tib͕uworo umu-unu; ọ dighi ọdidọ-aka-na-nti ha natara: mma-agha-unu erichapuwo ndi-amuma-unu, dika ọdum nke nēbibi ebibi.

31 Unu ọb͕ọ a, unu onwe-unu le Jehova. Ọ̀ bu ọzara ka M’buworo Israel? ma-ọ̀bu ala nke oké ọchichiri? gini mere ndim ji si, Ayi lupuru alupu; ayi agaghi-abiakute Gi ọzọ?

32 Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ọ̀ gēchezọ ihe-ichọ-nma-ya? nwayi aluru ọchu, ọ̀ gēchozọ ihe ike n’úkwù-ya? ma ndim echezọwom ubọchi nādighi ọnu-ọgugu.

33 Gini mere i ji eme ka uzọ-gi di nma ichọ ihu-n’anya? n’ihi ya ọbuná ndinyom ọjọ ka i zíworo uzọ-gi nile.

34 Ọzọ, n’ọnu-ọnu-uwe-gi ka achọtaworo ọbara nke nkpuru-obi nke ndi-ob͕eye nēmeghi ihe ọjọ: ọ bughi na ntipú-ulo ka i chọtara ha, kama ọ bu n’ihi ihe ndia nile.

35 Ma i siri, Emeghm ihe ọjọ; n’ezie iwe-Ya esiwo n’arum laghachi. Le, Mu na i ganēje n’ikpé, n’ihi na i siri, Emehieghm.

36 Gini mere i ji kpaghari nke-uku ib͕anwe uzọ-gi? ihere Ijipt gēme kwa gi, dika ihere Asiria mere gi.

37 Ọbuná n’ala nka ka i gēsi pua, aka-gi abua adi kwa n’isi-gi: n’ihi na Jehova ajuwo ihe-ntukwasi-obi-gi nile, ọ gaghi-aga-kwa-ra gi nke-ọma nime ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 3

1 Ọ si, Le, ọ buru na nwoke achupu nwunye-ya, nwayi ahu ewe si n’ebe ọ nọ la, we ghọ nwunye nke nwoke ọzọ, di mbu ya, ọ̀ gālu kwa ya ọzọ? àgaghi-emeru ala ahu emeru nke-uku? Ma gi onwe-gi akwawo iko, gi na ọtutu ndi-iko: ì si na i gālaghachikutem? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

2 Welie anya-gi abua le ebe nile di elu nke ọhia nādighi, hu; òle ebe gi na ndikom nēdinakọtaghi? N’uzọ nile ka i nọworo nēle anya ha, dika onye Arebia n’ọzara; i we were ikwa-iko-gi nile, were kwa ihe ọjọ gi, merua ala.

3 Ewe b͕ochie oké miri-ozuzo nile, miri-ozuzo ikpe-azu adighi kwa; ma egedege-iru nke nwayi nākwa iko ka i nwere, i juru ka etiye gi n’ọnọdu-ihere.

4 Ì sighi na mb͕e a kpọkuem, si, Nnam, di m’nwere n’ab͕ọghọ ka I bu?

5 Ọ̀ gēchebe iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi? Ọ̀ gēdebe ya rue ọgwugwu ihe nile? Le, i kwuwo otú a, i we me ihe ọjọ gi nile, we nwe ike.

6 Jehova we sim n’ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n’elu ugwu ọ bula di elu, na n’okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n’ebe ahu.

7 M’we si, mb͕e ọ mesiri ihe ndia nile, Ya laghachikutem; ma ọ laghachigh: nwa-nne-ya nke nāghọb͕u, bú Juda, we hu ya.

8 M’we hu na, mb͕e M’chupusiri Israel, nye ya akwukwọ nkewa-ya n’ihi ihe ndia nile, bú na Israel nke nādaghachi azu kwarari iko, na nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u aghọb͕u, Juda atughi egwu; ọ we je kwa iko, ọbuná ya onwe-ya.

9 O rue, site n’idi-nfe nke ikwa-iko-ya, na emeruru ala-ya, ọ we kwaso nkume, kwaso kwa osisi, iko.

10 Ma ọbuná n’ihe a nile nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u, bú Juda, ejighi obi-ya nile laghachikutem, kama o ji okwu-ugha, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

11 Jehova we sim, Israel nke nādaghachi azu egosiwo onwe-ya onye ezi omume kari Juda nke nāghọb͕u aghọb͕u.

12 Je, kpọsa okwu ndia n’uzọ Ugwu, si, Lata, gi Israel nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta; M’gaghi-edo unu iru iwe: n’ihi na onye-ebere ka M’bu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gaghi-edebe iwe rue mb͕e ebighi-ebi.

13 Nání mara ajọ omume-gi, na ọ bu Jehova, bú Chineke-gi, ka i jehieworo megide, i we wasara ndi ala ọzọ uzọ-gi nile n’okpuru osisi ndu ọ bula, ma olum ka unu nēgeghi nti, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

14 Latanu, umu nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta; n’ihi na Mu onwem bu di nwe unu: M’gēwere kwa unu, otù site n’otù obodo, abua site n’otù ab͕uru, M’gēme kwa ka unu biarue Zaion:

15 M’gēnye kwa unu ndi-ọzùzù-aturu dika obim si di, ndi gēji ihe-ọmuma na inwe-uche azù unu.

16 O gēru kwa, mb͕e unu baworo uba, mu kwa ọmùmù n’ala-unu, n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na ha agaghi-asi ọzọ, Ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; ọ gaghi-abà kwa n’obi: ha agaghi-echeta kwa ya; ha agaghi-eleta kwa ya; agaghi-eme kwa ya ọzọ.

17 Na mb͕e ahu ka ha gākpọ Jerusalem oche-eze Jehova; agāchikọta kwa mba nile rue ya, inye aha Jehova, rue Jerusalem: ha agaghi-ejeso kwa isi-ike nke obi ọjọ ha.

18 N’ubọchi ahu ulo Juda gējekuru ulo Israel, ha gāyikọ kwa bia site n’ala Ugwu rue ala ahu nke M’mere ka nna-unu-hà keta.

19 Ma Mu onwem siri, M’gēsi aṅa tiye gi n’etiti umu, we nye gi ala anāchọsi ike, ihe-nketa nke mara nma nke usu nile nke mba di iche? M’we si, Nnam ka unu gākpọm; unu agaghi-esi kwa n’isom laghachi azu.

20 N’ezie dika nwayi si ewere nghọb͕u rapu di-ya, otú a ka unu ghọb͕uworom, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

21 Olu ka anuru n’elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, bú ikwa-ákwá na aririọ-amara nile nke umu Israel; n’ihi na ha emewo ka uzọ-ha gbagọ, ha echezọwo Jehova, bú Chineke-ha.

22 Latanu, umu nke nādaghachi azu, M’gāgwọ ndaghachi-azu nile nke unu. Le ayi anya, ayi abiakutewo Gi; n’ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke-ayi.

23 N’ezie n’efu ka nzọputa ahu bu nke anēle anya ya site n’ugwu ntà di iche iche, bú ìgwè madu n’elu ugwu nile: n’ezie na Jehova, bú Chineke-ayi, ka nzọputa Israel di.

24 Ma ihe-ihere ahu erichapuwo ihe putara na ndọb͕u nna-ayi-hà dọb͕uru onwe-ha n’ọlu site na mb͕e ayi di na nwata; ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom.

25 Ka ayi dina ala n’ihere-ayi, ka ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya kpuchi kwa ayi: n’ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi mehieworo megide, ayi onwe-ayi na nna-ayi-hà, site na mb͕e ayi di na nwata we rue ta: ayi egeghi kwa nti n’olu Jehova, bú Chineke-ayi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 4

1 Ọ buru na i gālata, gi Israel, (ọ bu ihe si nọnu Jehova puta), Mu ka i gālaghachikute: ọ buru kwa na i gēwezuga ihe-árú-gi nile n’irum, i gaghi-awaghari;

2 i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n’ezi-okwu, na n’ikpé ziri ezi, na n’ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.

3 N’ihi na otú a ka Jehova siri ndikom Juda, si kwa Jerusalem, Lucharanu onwe-unu ubi, unu agha-kwa-la nkpuru n’etiti ogwu.

4 Bìenu onwe-unu úgwù nye Jehova, bìenu onwe-unu úgwù n’obi, unu ndikom Juda na ndi bi na Jerusalem: ka ọnuma m we ghara ipu dika ọku, we re nke ọ nādighi onye nēmenyu, site n’ihe ọjọ nke omume nile unu.

5 Gosinu na Juda, me-kwa-nu ka anuru ya na Jerusalem; si-kwa-nu, Fùanu opì-ike n’ala nka: kpọzuenu nkpu, si, Chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba kwa n’obodo nile ewusiri ike.

6 Bulienu ọkọlọtọ n’uzọ Zaion: latanu n’ulo ọsọsọ, unu eguzola: n’ihi na ihe ọjọ ka Mu onwem nēme ka o si n’Ugwu bia, ya na ntipia uku.

7 Ọdum esiwo n’alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n’ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ghara inwe onye-obibi.

8 N’ihi nka kenu ákwà-nkpe n’úkwù-unu, tienu aka n’obi, kwasi kwa ákwá ike: n’ihi na iwe di ọku nke Jehova esighi n’aru ayi laghachi.

9 O gēru kwa n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), na obi eze gāla n’iyì, ya na obi ndi-isi; ibobo gānwu kwa ndi-nchu-aja n’aru, ọ gāb͕agwoju kwa ndi-amuma anya.

10 M’we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n’ezie I rafuwo ndi nka na Jerusalem nke-uku, si, Udo gādiri unu, ma mma-agha emetuwo nkpuru-obi aru.

11 Na mb͕e ahu ka agāsi ndi nka, si kwa Jerusalem, Ifufe di ọku, nke sitere n’ebe di elu nke ọhia nādighi ya nke di n’ọzara, nēfe n’uzọ ada ndim, ọ bughi ifucha afucha, ọ bughi kwa ime ka adi ọcha;

12 ifufe nke juru eju nke sitere n’ebe ndia gābiaram: ub͕u a Mu onwem gēkwu kwa ọkwu ikpé nile n’ebe ha nọ.

13 Le, dika igwe-oji ka ọ nārigota, ọ bu kwa dika oké ifufe ka ub͕ọ-ala-ya nile di: inyinya-ya nile di garagara kari ugo. Ahuhu gādiri ayi! n’ihi na ebibiwo ayi.

14 Sapu obi-gi n’ihe ọjọ, gi Jerusalem, ka ewe zọputa gi. Rùe ole mb͕e ka i gēme ka ajọ èchìchè-gi nile nọ ọnọdu-abali n’etiti gi?

15 N’ihi na otù olu nēgosi site na Dan, ọ nēme kwa ka anuru ajọ ihe site n’ugwu Efraim:

16 hotaranu mba nile; le, menu ka anuru ya megide Jerusalem, si, na ndi-nche nābia site n’ala di anya, ha we me ka olu-ha da megide obodo nile nke Juda.

17 Dika ndi nēdebe ubi, otú a ka ha nọ nēmegide ya buruburu; n’ihi na Mu ka ọ nupuworo isi n’okpuru, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

18 Uzọ-gi na omume-gi nile ewewo gi ihe ndia; nka bu ihe ọjọ gi; n’ihi na ọ di ilu, n’ihi na o rutuwo obi-gi aru.

19 Ngiri-afọm, ngiri-afọm! anamab͕ali na mb͕idi nile nke obim; obim nāsu udè nke-uku nimem; adighm-ab͕a nkiti; n’ihi na olu opì-ike ka i nuworo, nkpuru-obim, bú udà-opì agha.

20 Ntipia n’elu ntipia ka anākpọ; n’ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n’otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile.

21 Rùe ole mb͕e ka m’gāhu ọkọlọtọ, nu olu opì-ike?

22 N’ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n’ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.

23 Ahurum uwa, ma, le, ọ bu ihe tọb͕ọrọ n’efu na ihe tob͕oro nkiti; ahu-kwa-ram elu-igwe, ma ìhè-ha adighi.

24 Ahurum ugwu, ma, le, ha nāma jijiji, ugwu ntà nile me-kwa-ra nkapatu.

25 Ahurum, ma, le, ọ dighi madu di, anu-ufe nile nke elu-igwe efelawo kwa.

26 Ahurum, ma, le, ubi ọma bu ọzara, akwatusi-kwa-ra obodo-ya nile n’iru Jehova, n’iru iwe-Ya di ọku.

27 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Ebe tọb͕ọrọ n’efu ka ala nka nile gābu; ma M’gaghi-eme ka ọ gwusia.

28 N’ihi nka ka uwa gēru újú, elu-igwe nke di n’elu gēji kwa nji: n’ihi na ekwubewom, ezubewom, echègharighkwam, M’gaghi-esi kwa nime ya laghachi azu.

29 Site n’olu ndi-inyinya na ndi-ọb͕a-uta obodo a nile nāb͕alaga; ha abawo n’ọhia b͕ara ọchichiri, ọ bu kwa na nkume nile di elu ka ha rigoworo: obodo ọ bula ka arapuworo, ọ dighi kwa onye ọ bula nēbi nime ha.

30 Ma gi onwe-gi, mb͕e ebibiworo gi, gini ka i gēme? Mb͕e i geyi uwe uhie, mb͕e i gēke ihe-ichọ-nma ọla-edo, mb͕e i gēji ihe-ichọ-nma me ka anya-gi abua sa mbara, n’efu ka i nēme onwe-gi ka i ma nma; ndi-iko-gi ajuwo gi, ndu-gi ka ha nāchọ.

31 N’ihi na olu dika nke nwanyi ime nēme ka m’nuworo, ihe-nb͕u dika nwanyi nāmu nwa mbu ya, bú olu nke ada Zaion, o nēku ike ike, ọ nāb͕asa ọbu-aka-ya abua, si, Ahuhu dirim nọ̄! n’ihi na nkpuru-obim nāda #mbà n’iru ndi-ob͕u-madu.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 5

1 Jegharianu n’èzí nile nke Jerusalem, biko, hunu, we mara, chọ-kwa-nu n’amá-ya nile, ma ọ buru na unu gāchọta nwoke ọ bula, ọ buru na ọ di onye nēme ihe ekpere n’ikpé, onye nāchọ ikwesi-ntukwasi-obi; M’gāb͕aghara kwa obodo a.

2 Ma ọ buru na ha asi, Jehova nādi ndu; n’ezie n’okwu-ugha ka ha na-aṅu iyi.

3 Jehova, ànya-Gi abua adighi n’ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.

4 Mu onwem we si, N’ezie ndi nēnweghi ike ka ha bu: ha b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ha; n’ihi na ha amaghi uzọ Jehova, na ikpé nke Chineke-ha:

5 ka M’jekuru ndi uku, gwa ha okwu; n’ihi na ndi ahu mara uzọ Jehova, na ikpé nke Chineke-ha. Ma ndi ahu ab͕ajiwo yoke n’otù, tijie ab͕u nile.

6 N’ihi ya ọdum nke sitere n’oké ọhia gētib͕u ha, anu-ọhia wolf nke ala ihe nādighi gēbibi ha, agu ganēche obodo nile ha anya, agādọb͕u onye ọ bula nke nāpu nime ha: n’ihi na njehie-ha di ọtutu, ndaghachi-azu nile nke ha di kwa ike.

7 M’gēsi kwa aṅa b͕aghara gi? umu-gi arapuwom, we were ihe nābughi chi ṅu iyi: mb͕e M’mere ka ha rijue afọ, ha we kwa iko, ọ kwa n’ulo nwanyi nākwa iko ha nēdo onwe-ha n’usu ndi nāpunara madu ihe.

8 Inyinya azùru azù nke-oma nke nāb͕à nne-inyinya ka ha bu: nwoke ọ bula nime ha nēbeso nwunye madu-ibe-ya.

9 M’gaghi-eleta n’ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀?

10 Rigonu n’elu mb͕idi-ya nile, bibie; ma unu emela ka ọ gwusia: wezuganu alaka-ya nile: n’ihi na ọ bughi ihe Jehova nwere ka ha bu.

11 N’ihi na ulo Israel na ulo Juda aghọb͕uwom nke-uku, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

12 Ha agọnariwo Jehova, si, Ọ bughi Ya; ihe ọjọ agaghi-abiakwasi kwa ayi; ayi agaghi-ahu kwa mma-agha na oké unwu:

13 ndi-amuma gāghọ kwa ifufe, okwu-Ya adighi kwa nime ha: otú a ka agēme ha.

14 N’ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ji si otú a, N’ihi unu nēkwu okwu a, le, anameme okwum nke di n’ọnu-gi ka ha ghọ ọku, anameme kwa ka ndi ghọ nkú, ọ gērichapu kwa ha.

15 Le, anameme ka otù mba si n’ebe di anya biakwasi unu, ulo Israel, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta:) mba di ike ka ọ bu, mba nke sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka ọ bu, ọ bu mba nke i nādighi-ama asusu-ya, nke I nādighi-anu kwa ihe ha nēkwu.

16 Àkpà-àkú-ha di ka ílì ghere oghe, ha nile bu ndi-dike.

17 Ha gērichapu kwa owuwe-ihe-ubi-gi, na nri-gi, nke umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri: ha gērichapu ìgwè ewu na aturu-gi na ìgwè ehi-gi: ha gērichapu osisi vine gi na osisi fig i: ha gēji mma-agha titu obodo-gi nile ewusiri ike, nke gi onwe-gi nātukwasi ha obi.

18 Ma ọbuná n’ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’gaghi-eme ka unu gwusia.

19 Ọ gēru kwam mb͕e unu gāsi, N’ìhi gini ka Jehova, bú Chineke-ayi, meworo ayi ihe nile ndia? na i gāsi ha, Dika unu rapurum, we fè chi di iche iche nke ala ọzọ n’ala-unu, otú a ka unu gēfè ndi ala ọzọ n’ala nābughi nke unu.

20 Gosinu nka n’ulo Jekob, me kwa ka anuru ya nime Juda, si,

21 Biko, nurunu nka, unu ndi di nzuzu, nke obi amam-ihe nādighi; anya abua ka ha nwere, ma ha adighi-ahu uzọ; nti abua ka ha nwere, ma ha adighi-anu ihe:

22 ọ̀ bu Mu ka unu nādighi-atu egwum? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: ọ̀ gaghi-eb͕u unu nb͕u n’ihi irum? Mu onye doworo ájá ibu ókè nke oké osimiri, site n’ukpuru ebighi-ebi, ọ gaghi-agabiga kwa ya, ọ bu ezie na nmali-miri-ya nile nāmaghari, ma ha apughi; ọ bu ezie na ha nēbib͕o, ma ha adighi-agabiga ya.

23 Ma ndi nka nwere obi nēwezuga onwe-ya nānupu kwa isi; ha ewezugawo onwe-ha, we la.

24 Ha asighi kwa n’obi-ha, Biko, ka ayi tua egwu Jehova, bú Chineke-ayi, Onye nēnye oké miri-ozuzo, ma nke-mbu ma nke-ikpe-azu, na mb͕e-ya; ízù nile akara àkà nke owuwe-ihe-ubi ka Ọ nēdebere ayi.

25 Ajọ omume nile unu ewezugawo ihe ndia, nmehie nile unu eb͕ochiwo-kwa-ra unu ezi ihe.

26 N’ihi na ahuwo ndi nēmebi iwu n’etiti ndim: ha nēle anya buruburu, dika ndi-osi-ọnyà si eche anwu; ha esiwo ọnyà, ọ bu madu ka ha nānwude.

27 Dika nkata nnunu si ejuputa n’anu-ufe, otú a ka ulo nile ha juputara n’aghughọ: n’ihi nka ka ha ghọworo ndi uku, we buru ọgaranya.

28 Ha amawo abuba, aru-ha eb͕uwo àmùmà: e, emebigawo ihe ọjọ ókè: ha ekpeghi ọnu, bú ọnu nke nwa-nb͕ei, ka o we gara ha nke-ọma; ọ bu kwa ikpe nke ndi-ob͕eye ka ha nādighi-ekpe.

29 M’gaghi-eleta n’ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀?

30 Ihe-iju-anya na ihe jọb͕uru onwe-ya emewo n’ala;

31 ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n’aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n’anya: ma gini ka unu gēme n’ikpe-azu-ya?

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 6

1 Laghachinu n’ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n’etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n’elu Bet-hakarem: n’ihi na ihe ọjọ si n’Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku.

2 Nwayi ahu nke mara nma nke di kwa pekepeke, bú ada Zaion, ka M’gēme ka ọ la n’iyì.

3 Ya ka ndi-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ha gābiaru; ha ga-ama ulo-ikwū-ha n’akuku ya buruburu; ha gāzù aturu-ha, onye ọ bula n’ọnọdu nke aka ya.

4 Donu agha nsọ imegide ya; bilienu, ka ayi rigo n’etiti-ehihie. Ahuhu diri ayi! n’ihi na chi eruruwo, n’ihi na onyinyo anyasi nēsetipu onwe-ha.

5 Bilienu, ka ayi rigo n’abali, ka ayi bibie ulo-elu-ya nile.

6 N’ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Gbutuenu osisi-ya nile, wukọta obo-ihe imegide Jerusalem: nka bu obodo ahu agēleta; ọ bu nání nmeb͕u n’etiti ya.

7 Dika olùlù-miri si asuputa miri-ya, otú a ka obodo ahu suputaworo ihe ọjọ ya: ihe-ike na ipunara-madu-ihe ka anānu nime ya; n’irum mb͕e nile ka ọria na ọnyá-ntiputa di.

8 Ka adọ gi aka na nti, Jerusalem, ka nkpuru-obim we ghara ikewapu n’ebe i nọ; ka M’we ghara ime gi ebe tọb͕ọrọ n’efu, ala onye ọ bula nēbighi.

9 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ha gātutukọsi ndi Israel fọduru dika esi atutukọ nkpuru-vine fọduru: seghachi aka-gi dika ọghọ-nkpuru-vine n’elu alaka nile.

10 Ònye ka M’gāgwa okwu, b͕a kwa àmà, ka ha we nu? le, ihe anēbighi ùgwù ka nti-ha bu, ha apughi kwa iṅa nti: le, okwu Jehova aghọworo ha ihe-ita-uta; ọ dighi-atọ ha utọ.

11 Ma ọnuma Jehova juputara nimem; ike gwurum inagide ya: wukwasi ya n’aru umu-ntakiri n’èzí, na n’aru ìzù umu-okorọbia n’otù: n’ihi na agēwere kwa ma di ma nwunye, ma okenye ma onye juputara n’ubọchi ndu-ya.

12 Agēme kwa ulo nile ha ka ha ghọ ihe ndi ọzọ, ubi-ha na ndinyom-ha n’otù: n’ihi na M’gēseti akam n’aru ndi bi n’ala nka, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

13 N’ihi na site n’onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku; ọzọ, site n’onye-amuma we rue onye-nchu-aja onye ọ bula nēme ihe n’ugha.

14 Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.

15 Ọ̀ di ihere mere ha mb͕e ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n’ọnọdu-ihere ha mara: n’ihi nka ha gāda n’etiti ndi nāda ada: na mb͕e M’letara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.

16 Otú a ka Jehova siri, Guzonu n’uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya.

17 Eme-kwa-ram ka ndi-nche biliere unu, si, Ṅanu nti olu opì-ike; ha we si, Ayi agaghi-aṅa nti.

18 N’ihi nka nurunu, unu mba nile, mara kwa, unu nzukọ, ihe di n’etiti ha.

19 Nuru, gi uwa: le, Mu onwem nēme ka ihe ọjọ biakwasi ndi nka, bú nkpuru nke èchìchè nile ha, n’ihi na okwum nile ka ha nāṅaghi nti; iwum kwa, ha ajuwo ya.

20 N’ìhi gini kwa ka frankincense ji biakutem site na Sheba, calamus ọma kwa site n’ala di anya? àjà-nsure-ọku-unu, ha abughi ihe natọ utọ, àjà-unu kwa, ha atọghm utọ.

21 N’ihi nka ka Jehova ji kwue otú a, si, Le, M’ganētiye ihe-isu-ngọngọ di iche iche n’iru ndi nka: nna na umu-ha gāsukwasi kwa ha ngọngọ; onye-ab͕ata-obi na eyì-ya gāla n’iyì.

22 Otú a ka Jehova siri, Le, otù ndi nēsi n’ala Ugwu bia: mba uku ka agākpọte kwa site na nsọtu nile nke uwa.

23 Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ọ bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕o dika okè osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n’usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Zaion.

24 Ayi anuwo ùdé-ya; aka-ayi akudawo: ihe-nb͕u ejidewo ayi, ihe-nb͕ali dika nke nwayi ime nēme.

25 Apula ibà n’ọhia, eje-kwa-la ije n’uzọ; n’ihi na onye-iro nwere mma-agha, ujọ di buruburu.

26 Ada nke ndim, ke ákwà-nkpe n’úkwù-gi, turua onwe-gi na ntu: mere onwe-gi oruru-újú dika nke nwa-nwoke enwere nání ya, bú iti-aka-n’obi di ilu nke-uku; n’ihi na ọ bu na mberede ka onye nāpunara madu ihe gābiakwasi ayi.

27 Onye-ọnwunwa-ọla ka M’boro gi n’etiti ndim, ya na ebe ewusiri ike; ka i we mara nwa kwa uzọ-ha.

28 Ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha nke-uku, nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ: ọla na ígwè ka ha bu: ndi ahu nile bu ndi-nbibi.

29 Eko erewo ọku; ọku erechapuwo opi: n’efu ka ha nuchaworo nke-uku; n’ihi na anuchapughi ndi ọjọ.

30 Ọla-ọcha ajuru aju ka akpọrọ ha, n’ihi na Jehova ajuwo ha.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 7

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2 Guzo n’ọnu-uzọ-ama ulo Jehova, we kpọsa okwu a n’ebe ahu, si, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile, ndi nābà n’ọnu-uzọ-ama ndia ikpọ isi ala nye Jehova.

3 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Menu ka uzọ nile nke unu na omume nile nke unu di nma, M’gēme kwa ka unu biri n’ebe a.

4 Unu atukwasila obi-unu n’okwu-ugha nile, si, Ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ka ndi a bu.

5 N’ihi na ọ buru na unu eme ka uzọ nile unu na omume nile unu dizue nma; ọ buru na unu emezue ihe ekpere n’ikpe n’etiti otù onye na ibe-ya;

6 ọ buru na unu adighi-emeb͕u ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwanyi di-ya nwuru, ọ buru kwa na unu adighi-awusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n’ebe a, ọ buru kwa na unu adighi-ejeso chi ọzọ di iche iche ime onwe-unu ihe ọjọ:

7 M’gēme kwa ka unu biri n’ebe a, n’ala nka nke M’nyere nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-egi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n’iru.

8 Le, unu onwe-unu nātukwasi obi-unu n’okwu-ugha nile, o we ghara ibara unu urù.

9 Ùnu ganēzu ori, nēb͕u madu, nākwa iko, nāṅu iyi ugha, nēsurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nējeso chi ọzọ di iche iche nke unu nāmaghi,

10 we bia guzo n’irum n’ulo a, nke akpọkwasiri aham, si, Anaputawo ayi; ka unu we me ihe-árú ndia nile?

11 Ọ̀ bu ọb͕à ndi nēme ihe-ike ka ulo a, nke akpọkwasiri aham, ghọworo n’anya-unu? Ọbuná Mu onwem, le, ahuwom ya, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

12 Otú ọ di, biko, jeruenu ọnọdum nke di na Shailo, ebe M’mere ka aham biri na mbu, hunu ihe M’mere ya n’ihi ihe ọjọ nke ndim, bú Israel.

13 Ma ub͕u a, n’ihi na unu aluwo ọlu ndia nile, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), M’we gwa unu okwu, nēbili n’isi-ututu nēkwu, ma unu anughi; M’we kpọ unu òkù, ma unu azagh:

14 M’gēme kwa ulo a, nke akpọkwasiri aham, nke unu onwe-unu nātukwasi obi, M’gēme kwa ọnọdu a nke M’nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, M’gēme ha dika M’gēme ha dika M’mere Shailo.

15 M’gēsi kwa n’irum tufue unu, dika M’tufuru umu-nna-unu nile, bú nkpuru nile nke Efraim.

16 Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha, ariọ-kwa-lam aririọ: n’ihi na M’gaghi-anānu olu-gi.

17 Ì dighi-ahu ihe ndi ahu nēme n’obodo nile nke Juda na n’èzí nile nke Jerusalem?

18 Umu-ha nāchikọta nkú, ndi bu nna nāfunwu ọku, ndinyom-ha nāgwọ utu ọka flour koro eko, imere eze-nwanyi nke elu-igwe achicha, na iwusiri chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe.

19 Ọ̀ bu Mu ka ndi ahu nākpasu iwe? (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta); ọ̀ bughi ha onwe-ha ka ha nākpasu iwe, ka ihere we me ha n’iru?

20 N’ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, iwem na ọnumam ka anāwusi n’ebe a, n’aru madu, na n’aru anu-ulo, na n’aru osisi ọhia, na n’aru nkpuru nke ala-ubi; ọ gēre kwa ọku, agaghi-emenyu kwa ya.

21 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Tukwasinu àjà-nsure-ọku nile unu n’elu àjà nile unu, ri-kwa-nu anu.

22 N’ihi na agwaghm nna-unu-hà okwu, enyeghkwam ha iwu n’ubọchi M’mere ka ha si n’ala Ijipt puta, bayere ihe nile nke àjà-nsure-ọku na nke àjà ọzọ:

23 kama ọ bu okwu a ka M’nyere ha n’iwu, si, Genu nti olum, M’gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi: je-kwa-nu ije n’uzọ nile nke M’nēnye unu n’iwu, ka o we diri unu nma.

24 Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha-n’ala, ha we jegharia na ndum-ọdu nile na n’isi-ike nke obi ọjọ ha, ha we daghachi azu, ghara iga n’iru.

25 Site n’ubọchi ahu nke nna-unu-hà ji si n’ala Ijipt puta rue ta ka M’nēzitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n’isi-ututu nēzite ha kwa-ubọchi:

26 ma ha egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n’ala, ha we kwesie olu-ha ike: ha mere ihe ọjọ kari ndi bu nna-ha.

27 I gāgwa kwa ha okwu ndia nile; ma ha agaghi-ege gi nti: i gākpọ kwa ha òkù; ma ha agaghi-aza gi.

28 I gāsi kwa ha, Nka bu mba ahu nke nēgeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, nke nānaraghi kwa idọ-aka-na-nti: ikwesi-ntukwasi-obi alawo n’iyì, ebipuwo kwa ya n’ọnu-ha.

29 Kọpu isi-gi, Jerusalem, tufue ya, buli kwa abù-ákwá n’elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi; n’ihi na Jehova ajuwo, rapu kwa ọb͕ọ nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.

30 N’ihi na umu Juda emewo ihe jọrọ njọ n’anyam; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: ha edowo ihe-árú nile ha n’ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.

31 Ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Tofet, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, isure umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n’ọku; bú ihe nke M’nēnyeghi n’iwu, ọ bataghi kwa n’obim.

32 N’ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ya Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u: ha gēlì kwa ozu na Tofet n’ihi na ebe ilì ozu adighi.

33 Ozu ndi nka gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri; ọ dighi kwa onye nāruli ha.

34 M’gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n’obodo nile nke Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem: n’ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 8

1 Na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta), ha gēkpoputa ọkpukpu ndi-eze Juda, na ọkpukpu ndi-isi-ya, na ọkpukpu ndi-nchu-àjà, na ọkpukpu ndi-amuma, na ọkpukpu ndi bi na Jerusalem, n’íhì-ha:

2 ha gāb͕asa ha n’anyanwu, na n’ọnwa, na n’usu nile nke ihe elu-igwe, nke ha huworo n’anya, nke ha fèwo-kwa-ra, nke ha jesowo-kwa-ra, nke ha chọwo-kwa-ra, nke ha kpọwo-kwa-ra isi ala nye: agaghi-achikọta ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu nke di n’iru ala ka ha gāghọ.

3 Ha gārọputa kwa ọnwu kari ndu, bú ndi nile fọduru, ndi fọduru site n’ab͕uru ọjọ a, ndi fọduru n’ebe nile M’chusaworo ha, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova nke ndi-agha puta.

4 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Ha ga-ada, ghara ibili ọzọ? madu, ọ̀ gādaghachi azu, ghara ilata?

5 Gini mere ndi nka nke Jerusalem ji adaghachi azu na ndaghachi-azu ebighi-ebi? ha ejidesiwo aghughọ ike, ha ajuwo ilọta.

6 Aṅaram nti we nu, ihe nēzighi ezi ka ha nēkwu: ọ dighi onye ọ bula chèghariworo uche n’ihe ọjọ ya, si, Gini ka m’meworo? onye ọ bula echighariwo ba n’ọb͕ub͕a-ọsọ-ya, dika inyinya nke nāb͕abiga ọsọ ókè n’agha.

7 Ọbuná ub͕ala n’elu-igwe mara mb͕e-ya nile akara àkà; ọzọ, nduru na eleke na okwoli nāriba mb͕e ọbibia-ha ama; ma ndim amaghi ikpé Jehova.

8 Ùnu si aṅa si, Ndi mara ihe ka ayi bu, iwu Jehova di kwa n’aka ayi? Ma otú o di, le, okwu-ugha ka pen ugha nke ndi-ode-akwukwọ meworo ya.

9 Ihere emewo ndi mara ihe, ha atuwo ujọ, ewe jide ha: le, okwu Jehova ka ha juworo; ọ̀ bu kwa aha amam-ihe gini ka ha nwere?

10 N’ihi nka ka M’gāchiri nwunye-ha nye ndi ọzọ, were kwa ubi nile ha nye ndi gēnweta ha: n’ihi na site n’onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku, site n’onye-amuma we rue onye-nchu-àjà onye ọ bula nēme ihe n’ugha.

11 Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.

12 ọ̀ di ihere mere ha megbe ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n’ọnọdu-ihere ha mara: n’ihi nka ha gāda n’etiti ndi nāda ada: na mb͕e eletara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.

13 M’gēkpochapusi ha; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: nkpuru-vine adighi n’osisi vine, ọ dighi fig di n’osisi fig, akwukwọ akpọnwuwo kwa; M’we doro ha ndi nāgabiga ha n’isi.

14 N’ìhi gini ka ayi onwe-ayi nānọdu ala? chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba n’obodo nile ewusiri ike, we debe ọnu-ayi du n’ebe ahu: n’ihi na Jehova, bù Chineke-ayi, emewo ka ayi debe ọnu-ayi du, O mewo kwa ka ayi ṅua miri ńsí, n’ihi na ayi emehiewo megide Jehova.

15 Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwọ, ma le, oké egwu.

16 Site na Dan ka anuru ima-imi nke inyinya-ya nile: site n’olu ọbube nile nke inyinya-ya nile di ike ala nka nile amawo jijiji; ha we bia richapu ala na ùjú-ya; obodo na ndi bi nime ya.

17 N’ihi na, le, M’ganēzite agwọ, bú ubí, n’etiti unu, nke ọ nādighi urà agārà ha; ha gāta kwa unu aru; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

18 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na agamab͕asa irum megide unu taa! n’arum ka aru nādighi obim ike.

19 Le, ọ bu olu ntiku nke ada ndim site n’ala di anya nke-uku: Jehova, Ọ̀ nọghi na Zaion? Eze-ya, Ọ̀ nọghi nime ya? Gini mere ha ji were arusi nile ha apiri api, were kwa ihe-efu nile nke onye ala ọzọ, kpasuem iwe?

20 Owuwe-ihe-ubi agabigawo, nghọkọta-nkpuru agwusiwo, ma ayi onwe-ayi, azọputaghi ayi.

21 N’ihi nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim ka ab͕ajiworom ukwu na aka: anameyi uwe-nkpe; iju-anya ejidesiwo m ike.

22 Ọ̀ dighi balm di na Gilead? ọ̀ dighi dibia nọ n’ebe ahu? ọ̀ bu kwa gini mere anu-aru ọhu nējighi epuchi n’aru ada ndim?

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 9

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na isim bu miri miri, asi anyam abua bu isi-iyi nke anya-miri, ka m’we kwa ákwá n’ehihie na abali bayere ndi eb͕uru eb͕u nke ada ndim!

2 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na m’nwere ebe inọ ọnọdu-abali nke ndi-ije n’ọzara; ka m’we rapu ndim, si n’ebe ha nọ la! n’ihi na ha nile bu ndi nākwa iko, nzukọ ndi-nghọb͕u.

3 Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n’ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n’ala: n’ihi na ha esiwo n’ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

4 Lezienu anya, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, unu atukwasi-kwa-la nwa-nne ọ bula obi: n’ihi na nwa-nne ọ bula nējidesi ikiri-ukwu nwa-nne-ya ike, ọzọ, onye-ab͕ata-obi ọ bula nējeghari nāb͕a àmà ọjọ.

5 Ha nākwa kwa emò, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, ma ezi-okwu ka ha nādighi-ekwu: ha ezíwo ire-ha ikwu okwu-ugha; ọ bu n’ime ajọ omume ka ike gwuru ha.

6 Ebe-obibi-gi di n’etiti aghughọ; n’aghughọ ka ha juru imaram; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

7 N’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue otú a, si, Le, M’gaje inucha ha, we nwaputa ha; n’ihi na M’gēsi aṅa me n’ihi ada ndim?

8 Àkú nke nēb͕u eb͕u ka ire-ha bu; okwu aghughọ ka o kwuworo: n’ọnu-ya ka madu nāgwa onye-ab͕ata-obi-ya okwu udo, ma n’obi-ya ọ nēche ya anwu.

9 M’gaghi-eleta ha n’ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ mba nke di otú a ọ́bọ̀?

10 Ugwu nile ayi ka m’gēbuliri ikwa-ákwá na igo-ákwá, buli-kwa-ra ebe-ita-nri nile nke ọzara abù-ákwá, n’ihi na esuresiwo ha ọku, ọ we ghara idi onye ọ bula nāgabiga; anughi kwa olu anu-ulo; ma anu-ufe nke elu-igwe ma anumanu ab͕alagawo, ha alawo.

11 M’gēme kwa Jerusalem ka ọ ghọ obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nke nkita-ọhia; ọzọ, obodo nile nke Juda ka M’gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, onye-obibi we ghara idi.

12 Ònye bu onye mara ihe, ka o we ghọta nka ònye bu kwa onye ahu ọnu Jehova gwaworo okwu, ka o we gosi ya? n’ìhi gini ka ala nka laworo n’iyì, esure kwa ya ọku dika ọzara, onye-ngabiga we ghara idi?

13 Jehova we si, N’ihi na ha arapuwo iwum nke M’tiyere n’iru ha, na n’ihi na ha egeghi nti olum, ghara kwa ijeghari nime ya;

14 ma ha ejesowo isi-ike nke obi-ha, jeso kwa Bealim, nke ndi bu nna-ha zíri ha:

15 n’ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a, Le, M’gaje ime ka ha, bú ndi nka, rie wormwood, M’gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí.

16 M’gāchusa kwa ha n’etiti mba nile, ndi ha nāmaghi, ma ha onwe-ha ma ndi bu nna-ha: M’gēziso ha mma-agha, rue mb͕e M’mere ka ha gwusia.

17 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Tugharinu uche, kpọ-kwa-nu ndinyom nābù abù-ákwá, ka ha we bia; ziga-kwa-nu ikpọ ndinyom mara ihe, ka ha we bia:

18 ka ha me kwa ngwa, buliere ayi igo-ákwá, ka anya-miri we si n’anya-ayi rùda, ka miri we si kwa na mbubere-anya-ayi rùputa.

19 N’ihi na olu nke igo-ákwá ka anuworo site na Zaion, Le ka esi bibisia ayi nke-uku! ihere emewo ayi nke-uku, n’ihi na ayi arapuwo ala-ayi, n’ihi na ha atudawo ebe-obibi nile ayi.

20 Ma nurunu okwu Jehova, unu ndinyom, ka nti-unu nara kwa okwu ọnu-Ya, zí-kwa-nu umu-unu ndinyom igo-ákwá, ka nwayi ọ bula zí kwa nwayi-ibe-ya abù-ákwá.

21 N’ihi na ọnwu arigobatawo na window nile nke ayi, ọ batawo n’ulo-elu nile nke ayi; ibipu umu-ntakiri n’èzí, na umu-okorọbia n’amá nile.

22 Kwue, si, Otú a ka ihe nke si n’ọnu Jehova puta siri, Ozu madu gāda dika ǹsí-anu n’ọhia, na dika nju-aka ọka n’azu onye nēwe ihe-ubi, ọ dighi kwa onye nāchikọta ha.

23 Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n’amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n’idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n’àkù-ya:

24 kama, onye nānya isi, ya nya isi na nka, na o nwere uche n’ebe M’nọ, we maram, na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ebere na ikpé ziri ezi na ezi omume n’uwa: n’ihi na ihe ndia atọwom utọ; ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

25 Le, ubọchi nābia, (ọbu ihe si N’ọnu Jehova puta), mb͕e M’gewere nmehie-ha leta ndi nile bìri úgwù n’ebìghi-úgwù-ha;

26 bú Ijipt, na Juda, na Edom, na umu Amon, na Moab, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha, ndi bi n’ọzara: n’ihi na mba nile bu ndi anēbighi úgwù, ulo Israel nile bu kwa ndi anēbighi úgwù n’obi.

Categories
JEREMAIA

JEREMAIA 10

1 Nurunu okwu Jehova gwaworo unu, unu ulo Israel:

2 Otú a ka Jehova siri, Unu amutala uzọ mba nile, unu atu-kwa-la ujọ ihe-iriba-ama di iche iche nke elu-igwe; n’ihi na mba nile nātu ujọ ha.

3 N’ihi na ukpuru nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: n’ihi na ọ bu nání osisi, nke madu b͕utuworo, ọlu aka abua nke onye-ọ̀kà ji anyu-ike alu ọlu.

4 Ha ji ọla-ọcha, ji kwa ọla-edo, eme ya ka ọ ma nma; ha ji ǹtú, ji kwa otùtù, eme ya ka o sie ike, ka ọ we ghara isu ngọngọ.

5 Ha di ka nkwu, ihe akpuru akpu ka ha bu, ha adighi-ekwu okwu: aghaghi ibu ha ebu, n’ihi na ha adighi-azọ ije. Unu atula egwu ha; n’ihi na ha agaghi-eme ihe ọjọ, ọzọ kwa, ime izi ihe adighi ha n’aka.

6 Ọ dighi nke di ka Gi ma-ọli, Jehova; Onye uku ka I bu, ihe di uku ka aha-Gi di kwa n’idi-ike.

7 Ònye nāgaghi-atu egwu Gi, Eze mba nile? n’ihi na Gi ka o kwesiri: n’ihi na n’etiti ndi-amam-ihe nile nke mba nile, na n’ala-eze nile ha, ọ dighi onye di ka Gi ma-ọli.

8 Ma ha nile n’otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.

9 Ọla-ọcha di nke etisaworo mbadamba nke anēsi na Tashish weta, na ọla-edo nke sitere n’Ufaz, bú ọlu onye-ọ̀kà na nke aka onye-nnucha-ọla: ákwà anunu na ákwà ododo bu uwe-oyiyi-ha; ọlu nke ndi mara ihe ka ha nile bu.

10 Ma Jehova bu Chineke n’ezi-okwu; Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, na eze nādi mb͕e ebighi-ebi: n’iwe-Ya uwa nāma jijiji, mba nile apughi kwa inagide iwe-Ya di ọku.

11 Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n’iyì pua n’uwa na n’okpuru elu-igwe, bú chi ndia.

12 Onye jiworo ike-Ya me uwa, Onye jiworo amam-ihe-Ya me ka elu-uwa dum madu bi guzosie ike, Onye jiworo nghọta-Ya setipu elu-igwe:

13 mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n’elu-igwe, O mee ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n’ulo-nkwakọba-Ya nile puta.

14 Nání anu-ọhia ka madu ọ bula ghọworo site n’ihe-ọmuma-ya; emewo ka ihere me onye-nnucha-ọla ọ bula site n’arusi-ya apiri api: n’ihi na okwu-ugha ka arusi-ya awuru awu bu, nku-ume adighi kwa nime ha.

15 Ihe-efu ka ha bu, ọlu ikwa-emò: na mb͕e nleta-ha ha gāla n’iyì.

16 Ọ bughi dika ihe ndia ka Òkè Jekob bu; n’ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

17 Chikọputa ihe-agha-gi n’ala, gi onye bi n’obodo anānọchigide n’agha.

18 N’ihi na otú a ka jehova siri, Le, M’gaje imapu ndi bi n’ala nka dika èbè na mb͕e a, M’gākpab͕u kwa ha, ka ha we chọputa ha.

19 Ahuhu dirim bayere nb͕aji ukwu na akam! ọnyám nke etiputa jọrọ njọ: ma mu onwem siri, N’ezie nka bu ọriam, m’gēburu kwa ya.

20 Emebisiwo ulo-ikwūm, etibìsiwo kwa udọ̀m nile: umum esiwo n’ebe m’nọ pua, ha anọghi kwa: ọ dighi kwa onye nēseti ulo-ikwūm nākwuli kwa ákwà-nkwubam.

21 N’ihi na ndi-ọzùzù-aturu aghọwo anu-ọhia, ma Jehova ka ha nājughi ase: n’ihi nka ha enweghi uche, aturu nile ha nāzù we b͕asa.

22 Ge nti olu nke ihe anuru, le, ọ nābia, oké ùzù agha nēsi kwa n’ala Ugwu bia, ime ka obodo nile nke Juda ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu, ebe-obibi nke nkita-ọhia.

23 Jehova, amawom na ọ bughi n’aka ya onwe-ya ka uzọ madu di: ọ bughi onye ọ bula nke nēje ije nwe ime ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.

24 Dọm aka na nti, Jehova, ma nání n’ikpé; adọlam aka na nti n’iwe-gi, ka I we ghara ibilatam.

25 Wukwasi mba nile ọzọ ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, wukwasi kwa ab͕uru nile ndi nākpọkughi aha-Gi: n’ihi na ha eripiawo Jekob, e, ha eripiawo ya, me ka ọ gwusia, ha emewo kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n’efu.