Categories
JENESIS

JENESIS 41

1 O rue, n’ọgwugwu ogologo arọ abua, na Fero nārọ nrọ: ma, le, o nēguzo n’akuku osimiri Nail.

2 Ma, le, ehi asa nēsi n’osimiri Nail rigoputa, ha mara nma ile anya ma kwa abuba n’anu-aru-ha; ha we nāta nri n’etiti ubi.

3 Ma, le, ehi asa ọzọ nēsi n’osimiri Nail rigoputa n’azu ha, ha jọrọ njọ ile anya, ta kwa aru n’anu-aru-ha; ha we guzo nso ehi asa ọzọ ahu n’usọ osimiri Nail.

4 Ehi ahu ndi jọrọ njọ ile anya, ndi takwara aru n’anu-aru-ha, we rie ehi asa ahu mara nma ile anya ma kwa abuba. Fero we teta.

5 O we raru ura rọ nrọ nke ub͕ò abua: ma, le, oko ọka asa nāwaputa n’otù ókpòrò, ha buru ibu di kwa nma.

6 Ma, le, oko ọka asa, nke fikpọrọ afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọkwara achakpọ, nēpuso ha n’azu.

7 Oko ọka asa nke fikpọrọ afikpọ we loda oko ọka asa ahu nke buru ibu so kwa nkpuru. Fero we teta, ma, le, ọ bu nrọ.

8 O rue, n’ututu, na mọ-ya b͕asasiri; o we ziga kpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile nke Ijipt, na ndi-ya nile mara ihe: Fero we kọrọ ha nrọ-ya; ma ọ dighi onye nākọrọ Fero isi-ha.

9 Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu we gwa Fero okwu, si, Nmehiem nile ka mu onwem nēhota ta:

10 Fero were iwe n’aru ndi-orù-ya, tinye m n’ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n’ulo onye-isi ndi-ob͕ū, mu na onye-isi ndi osi ite:

11 ayi we rọ nrọ n’otù abali, mu na ya; onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, otú a ka ayi rọrọ.

12 Ma ayi na otù okorọbia nọ n’ebe ahu, bú onye-Hibru, orù onye-isi nke ndi-ob͕ū nwere; ayi we kọrọ ya, ọ we kọrọ ayi isi nrọ-ayi; onye ọ bula n’etiti ayi dika nrọ-ya si di ka ọ kọrọ isi nrọ nye.

13 O rue na, dika ọ kọrọ isi nrọ nye ayi, otú a ka ọ di; mu ka ọ mere ka m’lata n’ọnọdum, ma ya ka ọ kwugburu.

14 Fero we ziga kpọ Josef, ha we me ka o si n’olùlù ahu b͕aputa: ọ kọpu isi-ya, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya nile, bakute Fero.

15 Fero we si Josef, Nrọ ka m’rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya: ma mu onwem anuwo okwu bayere gi, si, na i nānu nrọ ikọ isi-ya.

16 Josef we za Fero, si, Ọ dighm n’aka: Chineke gāza aziza udo nye Fero.

17 Fero we gwa Josef okwu, si, Na nrọm, le, m’nēguzo n’usọ osimiri Nail:

18 ma, le, ehi asa nēsi n’osimiri Nail rigoputa, ha mara abuba n’anu-aru-ha, ma kwa nma n’aru; ha we ta nri n’etiti ubi:

19 ma, le, ehi asa ọzọ nārigoputa n’azu ha, ha adighi nma, jọ njọ n’aru nke-uku, ta kwa aru n’anu-aru-ha, ahughm otú ndi ahu n’ijọ-njọ n’ala Ijipt nile:

20 ehi ahu ndi tara aru, ndi, jọkwara njọ, we rie ehi asa mbu mara abuba:

21 ma mb͕e ha basiri n’afọ-ha, amaghi na ha barari n’afọ-ha; ma ha jọrọ njọ ile anya, dika na nmalite. M’we teta.

22 M’we hu na nrọm, ma, le, oko ọka asa nāwaputa n’otù ókpòrò, ha soro nkpuru, di kwa nma:

23 ma, le, oko ọka asa, nke kpọnwuru akpọnwu, nke fikpọ-kwa-ra afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọ-kwa-ra, nēpuso ha n’azu:

24 oko ọka asa ahu nke fikpọrọ afikpọ we loda okọ ọka asa ahu di nma: m’we gwa ndi-ode-akwukwọ di nsọ; ma ọ dighi onye nēgosim ya.

25 Josef we si Fero, Nrọ, Fero, otù ka ọ bu: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka O gosiworo Fero.

26 Ezi ehi asa ahu, arọ asa ka ha bu; ezi oko ọka asa ahu, arọ asa ka ha bu kwa: nrọ ahu, otù ka ọ bu.

27 Ehi asa ahu nke tara aru, nke jọ-kwa-ra njọ, nke nārigoputa n’azu ha, arọ̄ asa ka ha bu, ha na oko ọka asa ahu nke di efù, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọrọ; ha gābu arọ asa nke oké unwu.

28 Nke ahu bu okwu nke m’gwara Fero: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka Ọ mere ka Fero hu anya.

29 Le, arọ asa nābia nke aganēriju afọ nke-uku n’ala Ijipt nile:

30 arọ asa nke oké unwu gēbili kwa ma ndia gasia; agēchezọ kwa iriju-afọ nile n’ala Ijipt; oké unwu ahu gēb͕upia ala ahu;

31 agaghi-ama iriju-afọ ahu n’ala nka n’ihi oké unwu ahu nke nēso ya; n’ihi na arọ́ ka ọ gādi nke-uku.

32 Ma ihe kpatara eji me ka nrọ ahu di okpukpu abua nye Fero, ọ bu n’ihi na emewo ka okwu ahu guzosie ike site n’ebe Chineke nọ, Chineke nēme kwa ngwa ime ya.

33 Ma ub͕u a, ka Fero leputa nwoke nwere nghọta, nke ma-kwa-ra ihe, ka o do kwa ya onye-isi ala Ijipt nile.

34 Ka Fero me nka, me kwa ka ndi-nlekọta ala nka, ka ọ were kwa otù uzọ n’uzọ ise nke ala Ijipt n’arọ asa ahu anēriju afọ.

35 Ka ha chikọta kwa ihe-oriri nile nke ezi arọ ndia nke nābia, ka ha kwakọba kwa ọka n’okpuru aka Fero ibu ihe-oriri n’obodo Ijipt nile, ka ha debe kwa ya.

36 Ihe-oriri ahu gābu ihe agēdebere ala nka rue arọ asa nke oké unwu ahu nke gādi n’ala Ijipt; ka ewe ghara ibipu ala nka n’oké unwu ahu.

37 Ihe ahu di nma n’anya Fero, na n’anya ndi-orù-ya nile.

38 Fero we si ndi-orù-ya, Àyi gāchọta madu dika onye a, bú nwoke nke mọ Chineke di nime ya?

39 Fero we si Josef, Ebe Chineke meworo gi ka i mara ihe a nile, ọ dighi onye nwere nghọta, nke ma-kwa-ra ihe, dika gi:

40 gi onwe-gi gābu onye-isi ulom, ọ bu kwa n’okwu ọnu-gi ka ndim nile gēdo onwe-ha n’usoro: nání n’oche-eze ka m’gādi uku kari gi,

41 Fero we si Josef, Le, edowom i onye-isi ala Ijipt nile.

42 Fero we b͕upu nb͕a-aka-akàrà n’aka-ya, b͕aye ya n’aka Josef, yibe ya uwe nke ezi ákwà ọcha, tukwasi iyab͕a ọla-edo n’olu-ya,

43 me ka o were ub͕ọ-ala nke-abua o nwere nāga-ghari; ha we kpọ nkpu n’iru ya, si, B͕u ikpere n’ala: o we do ya onye-isi ala Ijipt nile.

44 Fero we si Josef, Mu onwem bu Fero, asi kwa na i nọghi ya ọ dighi onye ọ bula gēweli aka-ya ma-ọbu ukwu-ya n’ala Ijipt nile.

45 Fero we kpọ aha Josef Zafenat-pania; o nye ya Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, na nwunye. Josef we pua jeghari n’ala Ijipt.

46 Josef b͕ara orú arọ na iri mb͕e o guzoro n’iru Fero eze Ijipt. Josef we si n’iru Fero pua, gabiga n’ala Ijipt nile.

47 N’arọ asa ahu nke anēriju afọ ala we nēme nri ri nne.

48 O we chikọta ihe-oriri nile nke arọ asa ahu nke di n’ala Ijipt, tiye ihe-oriri ahu n’obodo nile: ihe-oriri nke ubi nke obodo ọ bula nke di ya gburugburu ka o tiyere n’etiti ya.

49 Josef we kwakọba ọka dika ájá nke oké osimiri, nēme ka ọ ba uba nke-uku, rue mb͕e ọ rapuru igu ya ọnu; n’ihi na ọ dighi nguta.

50 Amuru umu-ndikom abua nye Josef tutu arọ oké unwu abia, ndi Asenat nwa-nwayi Poti-fera, bú onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya.

51 Josef we kpọ aha ọkpara-ya Manase: si, N’ihi na Chineke emewom ka m’chezọ ndọb͕u nile m’dọb͕uru onwem n’ọlu na ulo nile nke nnam.

52 Aha nke-abua ka ọ kpọrọ Efraim: si, N’ihi na Chineke emewom ka m’mua ọmùmù n’ala ewedaram ala.

53 Arọ asa ahu nke nriju-afọ, nke di n’ala Ijipt, we gwu.

54 Arọ asa ahu nke oké unwu we malite ibia, dika Josef siri; oké unwu we di n’ala nile; ma nri di n’ala Ijipt nile.

55 Agu we nāgu ala Ijipt nile, ndi ala ahu we tikue Fero inye ha nri: Fero we si ndi Ijipt nile, Jekurunu Josef, ihe ọ si unu me, menu ya.

56 Oké unwu ahu we dikwasi n’elu uwa nile: Josef we meghe ebe nile nke ọka di nime ha, ọ we re ọka nye ndi Ijipt; oké unwu ahu we sie ike n’ala Ijipt.

57 Ma uwa nile biaruru Ijipt, biakute Josef, izuru ọka; n’ihi na oké unwu ahu siri ike n’uwa nile.

Categories
JENESIS

JENESIS 42

1 Jekob we hu na ọka di n’Ijipt, Jekob we si umu-ya ndikom, N’ìhi gini ka unu nēlerita onwe-unu anya?

2 Ọ si kwa, Le, anuwom na ọka di n’Ijipt: ridanu n’ebe ahu, si n’ebe ahu zutara ayi; ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu.

3 Umu-nne Josef iri we rida isi n’Ijipt zuta ọka.

4 Ma Benjamin, bú nwa-nne Josef, ka Jekob nēzigaghi ka ya na umu-nne-ya yikọ je; n’ihi na ọ siri, Ka ajọ ihe we ghara idakwasi ya.

5 Umu Israel we bia izuru ọka n’etiti ndi nābia: n’ihi na oké unwu ahu di n’ala Kenean.

6 Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n’ala.

7 Josef we hu umu-nne-ya, ọ mata ha, ma ọ mere onwe-ya dika onye ala ọzọ n’ebe ha nọ, ọ we kpayere ha uka ike, si ha, Òle ebe unu si bia? Ha si, Site n’ala Kenean izuru ihe-oriri.

8 Josef we mata umu-nne-ya, ma ha onwe-ha amataghi ya.

9 Josef we cheta nrọ abua ahu nke ọ rọrọ bayere ha, ọ si ha, Ndi-nledo ka unu bu; ihu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo.

10 Ha si ya, É-è, onye-nwem, kama ndi-orù-gi abiawo izuru ihe-oriri.

11 Ayi nile, umu otù nwoke ka ayi bu, ndi ziri ezi ka ayi bu, ndi-orù-gi abughi ndi-nledo.

12 Ọ si ha, É-è, kama ọ bu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo ihu.

13 Ha si, Ayi onwe-ayi ndi-orù-gi bu umu-nne iri na abua, umu nke otù nwoke n’ala Kenean; ma, le, nke-ntà di n’aka nna-ayi ta, ma otù nke fọduru anọghi ndu.

14 Josef we si ha, Nke ahu bu ihe m’gwara unu, si, Ndi-nledo ka unu bu:

15 nime nka ka agānwaputa unu: Fero di ndu! unu agaghi-esi n’ebe a pua ma-ọli, ma ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà abiaghi n’ebe a.

16 Ziganu otù nime unu, ya kute nwa-nne-unu; ma unu onwe-unu, ka eke unu ab͕u, ka ewe nwaputa okwu nile unu, ma ezi-okwu di nime unu: ma ọ buru na ọ dighi otú a, Fero di ndu! ndi-nledo ka unu bu n’ezie.

17 Ọ we chikọta ha tiye n’ebe anēdebe ndi-nkpọrọ ubọchi atọ.

18 Josef we si ha n’ubọchi nke-atọ, Menu nka, di-kwa-nu ndu; n’ihi na Chineke ka mu onwem nātu egwu:

19 ọ buru na ndi ziri ezi ka unu bu, ka eke otù nwa-nne-unu ab͕u n’ulo ebe anēdebe unu; ma unu onwe-unu, jenu, burunu ọka la n’ihi oké unwu nke ulo-unu:

20 ma nwa-nne-unu nke-ntà ka unu gēme ka ọ biakutem; agēgosi kwa na okwu nile unu bu ezi-okwu, unu agaghi-anwu kwa. Ha we me otú a.

21 Ha we sirita onwe-ha, N’ezie ndi ikpe maworo bayere nwa-nne-ayi ka ayi bu, n’ihi na ayi huru nkpab͕u nke nkpuru-obi-ya, mb͕e ọ nāriọ ayi aririọ-amara, ma ayi anughi; n’ihi ya ka nkpab͕u a biakwasiworo ayi.

22 Reuben we za ha, si, Agwaghi m unu okwu, si, Unu emehiela megide nwa ahu; ma unu anughi? ọzọ kwa, ọbara-ya, le, anājuta ya.

23 Ma ha onwe-ha amaghi na Josef nānu ihe ha nēkwu; n’ihi na onye-nsughari nọ n’etiti ha.

24 O we si n’ebe ha nọ chighari onwe-ya, kwa, ákwá; o we laghachikute ha, gwa ha okwu, si n’etiti kuru Simeon, ke ya ab͕u n’iru anya-ha.

25 Josef we nye iwu, ha we kpojue ihe nile ha n’ọka, o nye kwa iwu inyeghachi ego-ha, nke onye ọ bula n’akpa-ya, na inye ha ihe ha gēri n’uzọ: ewe mere ha otú a.

26 Ha were ọka-ha bo inyinya-ibu-ha, si n’ebe ahu la.

27 Otù nime ha we meghe akpa-ya inye inyinya-ibu-ya nri-anu-ulo n’ebe inọ ọnọdu-abali, ọ we hu ego-ya; ma, le, ego ahu di n’ọnu akpa-ya.

28 Ọ si umu-nne-ya, Enyeghachiwo egom; ọzọ kwa, le, ọ di n’akpam: obi-ha we fepu, ha we nāmarita jijiji n’etiti onwe-ha, si, Gini bu nka Chineke meworo ayi?

29 Ha we biakute Jekob nna-ha, rue ala Kenean, gosi ya ihe nile dakwasiri ha; si,

30 Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, kpayere ayi uka ike, tiye ayi n’ebe anēdebe ndi-nkpọrọ dika ndi-nledo ala.

31 Ayi we si ya, Ndi ziri ezi ka ayi bu, ayi abughi ndi-nledo:

32 umu-nne iri na abua ka ayi bu, umu nke nna-ayi; otù anọghi ndu, nke-ntà di kwa n’aka nna-ayi taa n’ala Kenean.

33 Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, we si ayi, Nime nka ka m’gāmara na ndi ziri ezi ka unu bu: kwenu ka otù nwa-nne-unu nọdu n’akam, ma werenu ọka n’ihi oké unwu nke ulo-unu, la:

34 ma menu ka nwa-nne-unu nke-ntà biakute m: ka m’mara kwa na ọ dighi ndi-nledo unu bu, kama unu bu ndi ziri ezi: nwa-nne-unu ka m’gēnye unu, ọ bu kwa n’ala nka ka unu gāzu ahia.

35 O rue na, mb͕e ha nāwupu ihe di n’akpa-ha, le, ngwungwu ego nwoke ọ bula di n’akpa-ya: ha we hu ngwugwu ego-ha, ha onwe-ha na nna-ha, ha we tua egwu.

36 Jekob nna-ha we si ha, Mu ka unu b͕abaworo aka umu: Josef anọghi ndu, Simeon anọghi kwa ndu, ọ bu kwa Benjamin ka unu gēkuru: mu ka ihe ndia nile biakwasiworo.

37 Reuben we gwa nna-ya okwu, si, Umum ndikom abua ka i gēme ka ha nwua, ma ọ buru na emeghi m ka ọ biakute gi: nye ya n’akam, mu onwem gēme kwa ka ọ laghachikute gi.

38 Ọ si, Nwam agaghi-eso unu rida; n’ihi na nwa-nne-ya anwuwo, ya onwe-ya, nání ya, fọdukwara: asi na ajọ ihe adakwasi ya n’uzọ nke unu nēje na ya, unu gēweda kwa isi-awọm rue ala-mọ na nwuta.

Categories
JENESIS

JENESIS 43

1 Oké unwu ahu we sie ike n’ala ahu.

2 O rue, mb͕e ha risiri ọka nke ha siri n’Ijipt bute, na nna-ha siri ha, Jeghachinu, zutara ayi nwanti ihe-oriri.

3 Juda we gwa ya okwu, si, Nwoke ahu b͕asiri ayi àmà ike, si, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na nwa-nne-unu esoghi unu bia.

4 Ọ buru na i nēziga nwa-nne-ayi, ka ayi na ya we yikọ je, ayi gārida, zutakwara gi ihe-oriri:

5 ma ọ buru na i gaghi-eziga ya, ayi agaghi-arida: n’ihi na nwoke ahu siri ayi, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na unu na nwa-nne-unu ayikọghi bia.

6 Israel we si, N’ìhi gini ka unu mejọrọm, n’igosi nwoke ahu na unu nwere nwa-nne ọzọ?

7 Ha si, Nwoke ahu jusiri ajuju ike banyere ayi, banyekwara umu-nna-ayi, si, Nna-unu, ọ̀ nọ ndu ub͕u a? ọ̀ di nwa-nne-ọzọ unu nwere? ayi we gosi ya dika okwu ndia si di: àyi gāmara n’ezie na ọ gāsi, Menu ka nwa-nne-unu ridata?

8 Juda we si Israel nna-ya, Ziga nwa-okoro ahu ka mu na ya we yikọ je, ayi gēbili kwa, je; ka ayi we di ndu, ghara inwu, ma ayi, ma gi, ma umu-ntakiri-ayi.

9 Mu onwem gānọrọ ya mbe; n’akam ka i gājuta ya: ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, ọ buru kwa na akpotaghi m ya n’iru gi, emehiewokwam megide gi ubọchi ndum nile:

10 n’ihi na asi na ayi anọghi ọdù, n’ezie ayi gālatawori ub͕ò abua ndia.

11 Israel, bú nna-ha, we si ha, Ọ buru na ọ di otú a ub͕u a, menu nka; werenu ufọdu nime ihe makarisiri mma nke ala nka n’ihe-unu, wedakwara nwoke ahu onyinye-inata-iru-ọma, nwantī balm, na nwantī manu-aṅu, na uda di iche iche, na myrrh, na ákú, na almond:

12 were-kwa-nu ego okpukpu abua n’aka-unu: ego kwa nke enyegha-chiri n’ọnu akpa-unu, weghachinu ya n’aka-unu; eleghi anya ohihie-anya ka ọ bu:

13 kuru-kwa-nu nwa-nne-unu, bilie, jeghachikuru nwoke ahu:

14 Chineke Nke puru ime ihe nile, Ya nye kwa unu obi-ebere n’iru nwoke ahu, ka ọ we zitere unu nwa-nne-unu nke-ọzọ na Benjamin. Ma mu onwem, ọ buru na ab͕abaram aka umu, ab͕abawom aka umu.

15 Ndikom ahu we were onyinye-inata-iru-ọma ahu, ọ bu kwa okpukpu ego abua ka ha were n’aka-ha, na Benjamin; ha bilie, rida n’Ijipt, guzo n’iru Josef.

16 Josef we hu Benjamin n’etiti ha, ọ si onye bu onye-isi ulo-ya, Me ka ndikom ahu bata n’ulo, gi b͕u kwa anu, dozie ihe; n’ihi na mu ka ndikom ahu gēso ri ihe n’etiti-ehihie.

17 Nwoke ahu we me dika Josef siri ya; nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n’ulo Josef.

18 Ndikom ahu we tua egwu, n’ihi na emere ka ha bata n’ulo Josef; ha si, Ọ bu n’ihi ego ahu, nke enyeghachiri n’akpa-ayi na mmalite, ka anēme ka ayi onwe-ayi bata; ka ọ we chọ ayi okwu, dakwasi ayi, were ayi ibu ndi-orù, were kwa inyinya-ibu-ayi.

19 Ha we biakute nwoke ahu nso, nke bu onye-isi ulo Josef, ha gwa ya okwu n’ọnu-uzọ ulo ahu,

20 si, Biko, onye-nwem, ayi rida-tara n’ezie na nmalite izuru ihe-oriri:

21 o rue, mb͕e ayi biara n’ebe inọ ọnọdu-abali, na ayi meghere akpa-ayi, ma, le, ego onye ọ bula di n’ọnu akpa-ya, bú ego-ayi n’ọtùtù-ya zuru okè; ayi ewe-ghachiwo ya n’aka-ayi.

22 Ọ di kwa ego ọzọ ayi wedataworo n’aka-ayi izuru ihe-oriri: ayi amaghi onye tiyere ego-ayi n’akpa-ayi.

23 Ọ si Udo diri unu, unu atula egwu: Chineke-unu, na Chineke nke nna-unu, enyewo unu àkù zoro ezo n’akpa-unu: ego-unu rurum aka. Ọ me ka Simeon pukute ha.

24 Nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n’ulo Josef, ọ nye ha miri, ha we sa ukwu-ha; ọ nye kwa inyinya-ibu nile ha nri-anu-ulo.

25 Ha we dozie onyinye-inata-iru-ọma ahu rue ọbibia Josef n’etiti-ehihie: n’ihi na ha nuru na ọ bu n’ebe ahu ka ha gēri nri.

26 Josef we bata n’ulo-ya, ha we webatara ya onyinye-inata-iru-ọma ahu nke di n’aka-ha nime ulo, kpọ isi ala nye ya.

27 Ọ jua ha ajuju bayere udo-ha, si, Ọ̀ nọ n’udo, bú nna-unu, agadi ahu onye unu kwuru okwu bayere ya? Ọ̀ nọ kwa ndu?

28 Ha si, Orù-gi, bú nna-ayi, nọ n’udo, ọ nọ kwa ndu. Ha we rube isi, kpọ isi ala.

29 Ọ welie anya-ya abua, hu Benjamin nwa-nne-ya, bú nwa nke nne-ya, ọ si Ọ̀ bu nka bu nwa-nne-unu nke-ntà, onye unu gwaram okwu banyere ya? Ọ we si, Ka Chineke mere gi amara, nwam.

30 Josef we me ngwa; n’ihi na obi-ebere-ya nile di ọku n’aru nwa-nne-ya: ọ chọ ebe ọ gākwa ákwá; o we ba n’ime-ulo-ya, kwa ákwá n’ebe ahu.

31 Ọ sa iru-ya, puta, jisie onwe-ya ike, si, Dọkwasinu nri.

32 Ha we dọkwasiri ya nke ya iche, dọkwasikwara ha nke ha iche, dọkwasi-kwa-ra ndi Ijipt nke ha iche, bú ndi ya na ha nērikọ ihe: n’ihi na ndi Ijipt apughi isoro ndi-Hibru rie nri; n’ihi na ihe-árú ka nke ahu buru ndi Ijipt.

33 Ha we nọdu n’iru ya, ọkpara dika ọnọdu-ọkpara-ya si di, nke-ntà kwa dika ọnọdu-nke-ntà-ya si di; ibobo we nwurita ndikom ahu n’aru n’etiti ibe-ha.

34 Ewe si n’iru ya butere ha onyinye nri: ma onyinye nri Benjamin kariri onyinye nri ha nile ub͕o ise. Ha we so ya ṅu ihe-ọṅuṅu, we ṅujue afọ.

Categories
JENESIS

JENESIS 44

1 Ọ we nye onye bu onye-isi ulo-ya iwu, si, Kpojue akpa ndikom ahu n’ihe-oriri, otú ha puru ibu, tinye kwa ego onye ọ bula n’ọnu akpa-ya.

2 Tiye kwa ọkwam, bú ọkwa ọla-ọcha, n’ọnu akpa onye nke-ntà, ya na ego ọka-ya. Ọ we me dika okwu Josef si di, nke o kwuru.

3 Mb͕e ìhè ututu putara, ewe zilaga ndikom ahu, ha na inyinya-ibu-ha.

4 Ndi ahu siri n’obodo pua, ha erughi n’ebe di anya, ma Josef siri onye bu onye-isi ulo-ya, Bilie, chua ndikom ahu; mb͕e i ruru ha aru i gāsi ha, N’ìhi gini ka unu were ihe ọjọ kwughachi n’ọnọdu ezi ihe?

5 Ọ̀ bughi nka bu ihe onye-nwem ji aṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya ji kwa ya ariba ama n’ezie? unu emewo ihe ọjọ n’ihe nke unu mere.

6 Ọ we rue ha aru, gwa ha okwu ndia.

7 Ha si ya, N’ìhi gini ka onye-nwem nēkwu okwu dika okwu ndia? Ya buru ndi-orú-gi ihe-árú ime ihe dika ihe a.

8 Le, ego nke ayi hutara n’ọnu akpa-ayi, ayi si n’ala Kenean weghachiri gi ya: àyi gēsi kwa aṅa si n’ulo onye-nwe-gi zuru ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo?

9 Onye ọ bula n’etiti ndi-orù-gi agāchọta ya n’aka-ya, ya nwua, ọzọ kwa, ayi onwe-ayi gāghọrọ onye-nwem ndi-orù.

10 Ọ si, Ub͕u a kwa, dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi: onye agāchọta ya n’aka-ya gāburum orù; ma unu onwe-unu gābu ndi puru ya.

11 Ha we me ngwa, weda akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya, ha meghe akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya.

12 Ọ we chọsie ike, n’okenye ka ọ malitere, ọ bu kwa na nke-ntà ka ọ chọbiri: ewe chọta ọkwa ahu n’akpa Benjamin.

13 Ha we dọwa uwe-nb͕okwasi-ha, onye ọ bula o bo inyinya-ibu-ya ibu, ha we laghachi n’obodo.

14 Juda na umu-nne-ya we ba n’ulo Josef; ma ya onwe-ya nọ kwa n’ebe ahu rue mb͕e ahu: ha we da n’ala n’iru ya.

15 Josef we si ha, Òmume gini bu nka nke unu meworo? ùnu amaghi na nwoke nke di kam nāriba ama n’ezie?

16 Juda we si, Gini ka ayi gāsi onye-nwem? gini ka ayi gēkwu? àyi gēsi kwa aṅa gu onwe-ayi na ndi ezi omume? Chineke achọputawo ajọ omume ndi-orù-gi: le, ayi aghọworo onye-nwem ndi-orù, ma ayi onwe-ayi ma onye ahu nke achọta-woro ọkwa ahu n’aka-ya.

17 Ọ si, Ya burum ihe-árú ime nka: nwoke ahu achọtaworo ọkwa ahu n’aka-ya, ọnye ahu gāghọrọm orù; ma unu onwe-unu, rigo-kurunu nna-unu n’udo.

18 Juda we biakute ya nso, si, Biko, onye-nwe m, biko, ka orù-gi kwue okwu na nti onye-nwe m, iwe-gi adi-kwa-la ọku n’aru orù-gi: n’ihi na otú i di, otú ahu ka Fero di kwa.

19 Onye-nwem juru ndi-orù-ya, si, Ùnu nwere nna ma-ọbu nwa-nne?

20 Ayi we si onye-nwem, Ayi nwere nna, bú agadi, na otù nwa agadi-ya, bú onye ntà; nwa-nne-ya anwuruwo kwa, ọ we fọdu nwata ahu nání ya nye nne-ya, nna-ya hukwara ya n’anya.

21 I we si ndi-orù-gi, Me ka ọ ridakutem, ka m’we tukwasi anyam n’aru ya.

22 Ayi we si onye-nwem, Nwa-okoro ahu apughi irapu nna-ya: asi kwa na ọ rapu nna-ya, nna-ya gānwu.

23 I we si ndi-orù-gi, Ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà esoghi unu ridata, unu agaghi-ahu irum ọzọ ma-ọli.

24 O rue, mb͕e ayi rigokuru orù-gi, bú nnam, na ayi gosiri ya okwu nile nke onye-nwem.

25 Nna-ayi we si, Jeghachinu, zutara ayi nwantī ihe-oriri.

26 Ayi we si, Ayi apughi irida: ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà eso ayi je, ayi gārida kwa; n’ihi na ayi apughi ihu iru nwoke ahu, ma ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà esoghi ayi je.

27 Orù-gi, bú nnam, we si ayi, Unu onwe-unu mara na umu-ndikom abua ka nwunyem muru nyem:

28 otù nime ha we si n’ebe m’nọ pua, m’we si, N’ezie anu-ọhia adọb͕usiwo ya; ahughi-kwam ya rue ub͕u a:

29 ma ọ buru na unu ekupu kwa nka n’irum, ajọ ihe adakwasi kwa ya, unu gēweda isi-awọm rue ala-mọ n’ihe ọjọ.

30 Ma ub͕u a, mb͕e m’gābiakute orù-gi, bú nnam, ma nwa-okoro ahu esoghi ayi bia; ebe ekekọtara nkpuru-obi-ya na nkpuru-obi nwa-okoro ahu;

31 o gēru kwa, mb͕e ọ huru na nwa-okoro ahu esoghi ayi bia, na ọ gānwu: ndi-orù-gi gēweda kwa isi-awọ orù-gi, bú nna-ayi, rue ala-mọ na nwuta.

32 N’ihi na orù-gi nọrọ nwa-okoro ahu mbe n’ebe nnam nọ, si, Ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, eme-hiewokwam megide nnam ubọchi ndum nile.

33 Ma ub͕u a, biko, ka orù-gi nọdu n’ọnọdu nwa-okoro a iburu onye-nwem orù; ma ka nwa-okoro a soro umu-nne-ya rigo.

34 N’ihi na m’gesi aṅa rigokuru nnam, ma nwa-okoro a esoghm rigo? ka m’we ghara ilekwasi ihe ọjọ ahu anya nke gāchọta nnam.

Categories
JENESIS

JENESIS 45

1 Ma Josef apughi ijisi onwe-ya ike n’iru ndi nile guzoworo onwe-ha n’akuku ya; o we kpọ òkù, si, Me ka madu ọ bula si n’ebe m’nọ pua. Ọ dighi kwa onye ọ bula guzoro n’ebe ọ nọ, mb͕e Josef mere ka umu-nne-ya mara ya.

2 Ọ we welie olu-ya n’ikwa-ákwá: ndi Ijipt we nu, ulo Fero nukwara.

3 Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem bu Josef; nnam, ọ nọ ndu ub͕u a? Ma umu-nne-ya apughi iza ya; n’ihi na ha mara jijiji n’iru ya.

4 Josef we si umu-nne-ya, Biko, biakutenum nso. Ha we bia nso. Ọ si, Mu onwem bu Josef nwa-nne-unu, onye unu rere je n’Ijipt.

5 Ma ub͕u a ya ewutala unu, ya abu-kwa-la ihe iwe iwe di ọku n’anya-unu, na unu rerem bia n’ebe a: n’ihi na ọ bu idebe ndu ka Chineke zìrim ga n’iru unu.

6 N’ihi na arọ abua ndia ka oké unwu a di n’etiti ala: arọ ise fọdu-kwa-ra nke ilu-ọlu-ubi na owuwe-ihe-ubi nāgaghi-adi.

7 Chineke we zìem ga n’iru unu idoro unu n’uwa ndi fọduru, na idebere unu ndu ka unu buru oké ndi b͕apuru ab͕apu.

8 Ub͕a a kwa, Ọ bughi unu onwe-unu ziterem n’ebe a, kama Chineke: O we mem ka m’ghọrọ Fero nna, na onye-nwe ulo-ya nile, na onye nāchi ala Ijipt nile.

9 Menu ngwa, rigokuru nnam, si ya, Otú a ka nwa-gi Josef siri, Chineke, emewom ka m’ghọ onye-nwe Ijipt nile: ridakutem, atula ujọ:

10 i gēbi n’ala Goshen, nọkwam nso, gi onwe-gi, na umu-gi, na umu umu-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi, na ndi nile i nwere:

11 m’gāzù kwa gi n’ebe ahu; n’ihi na arọ ise nke oké unwu fọduru; ka ewe ghara inapu gi ihe nile, gi onwe-gi, na ulo-gi, na ndi nile i nwere.

12 Ma, le, anya-unu na anya nwa-nnem, bú Benjamin, nāhu na ọ bu ọnum nāgwa unu okwu.

13 Unu gēgosi kwa nnam nsọpurum nile n’Ijipt, na ihe nile nke unu huworo; unu gēme kwa ngwa me ka nnam ridata n’ebe a.

14 Ọ we dakwasi Benjamin, bú nwa-nne-ya, n’olu, kwa ákwá; Benjamin kwa-kwa-ra ákwá n’olu-ya.

15 Ọ we sutu umu-nne-ya nile ọnu, kwakwasi ha ákwá: emesia umu-nne-ya kpayere ya uka.

16 Ewe nu ùdé-ya n’ulo Fero, si, Umu-nne Josef abiawo: ọ di nma n’anya Fero, na n’anya ndi-orù-ya.

17 Fero we si Josef, Si umu-nne-gi, Menu nka; bonu anumanu-unu ibu, la, ba n’ala Kenean;

18 chiri-kwa-nu nna-unu na ulo-unu, biakutem: ka m’nye kwa unu ezi ihe nke ala Ijipt, unu gēri kwa urù ala nka.

19 Ma gi onwe-gi ka enyeworo iwu, menu nka; sinu n’ala Ijipt chiri ub͕ọ-ala n’ihi umu-ntakiri-unu, na n’ihi nwunye nile unu, kuru-kwa-nu nna-unu, bia.

20 Anya-unu adi-kwa-la n’ihe-unu; n’ihi na ezi ihe nke ala Ijipt nile, ọ bu unu nwe ya.

21 Umu Israel we me otú a: Josef we nye ha ub͕ọ-ala n’okwu-ọnu Fero, o nye kwa ha ihe ha gēri n’uzọ.

22 Ha nile n’otù ka o nyere uwe-nb͕okwasi nb͕anwe; ma o nyere Benjamin ọgu nkpuru-ego ọla-ọcha iri na ọgu ise na uwe-nb͕okwasi nb͕anwe ise.

23 O ziga-kwa-ra nna-ya otú a; inyinya-ibu iri nēbu ufọdu n’ezi ihe nke Ijipt, na nne-inyinya-ibu iri nēbu ọka na achicha na nri nna-ya gēri n’uzọ.

24 Ọ we zilaga umu-nne-ya, ha la: ọ si ha, Unu esela okwu n’uzọ.

25 Ha si n’Ijipt rigo, ba n’ala Kenean, biakute Jekob nna-ha.

26 Ha gosi ya, si, Josef nọ ndu ub͕u a, ha gosi kwa ya na ọ bu ya nāchi ala Ijipt nile. Obi-ya we b͕afue, n’ihi na ọ kweghi ha.

27 Ha we gwa ya okwu Josef nile nke ọ gwara ha: mb͕e ọ huru ub͕ọ-ala nile nke Josef ziri ibute ya, mọ nke Jekob, bú nna-ha, we di ndu:

28 Israel we si, O zuwo; Josef, bú nwam, nọ ndu ub͕u a: ka m’je, hu ya anya tutu mu anwua.

Categories
JENESIS

JENESIS 46

1 Israel we bulie ije, ya na ndi nile o nwere, ọ biarue Bia-sheba, chuara Chineke nke nna-ya Aisak aja.

2 Chineke we gwa Israel okwu n’ọhù nke abali, si, Jekob, Jekob. Ọ si Lekwam.

3 Ọ si, Mu onwem bu Chineke, bú Chineke nke nna-gi: atula egwu irida n’Ijipt; n’ihi na mba uku ka M’gēme gi ka i ghọ n’ebe ahu.

4 Mu onwem gēso gi rida n’Ijipt; ọ bu kwa Mu onwem gēme ka i rigota kwa n’ezie: Josef gātukwasi kwa aka-ya n’anya-gi abua.

5 Jekob we si na Bia-sheba bilie: umu Israel we buru Jekob, bú nna-ha, na umu-ntakiri-ha, na nwunye nile ha, n’ub͕ọ-ala nke Fero zitereri ibu ya.

6 Ha chiri anu-ulo-ha, na àkù-ha, bú nke ha kpatarari n’ala Kenean, bata n’Ijipt, bú Jekob na nkpuru-ya nile tiyere onwe-ya:

7 ya na umu-ya ndikom, na umu-ndikom nke umu-ya ndikom, umu-ya ndinyom, na umu-ndinyom nke umu-ya ndikom, ọ bu nkpuru-ya nile ka o mere ka ha so ya bata n’Ijipt.

8 Ma ndia bu aha umu Israel, ndi batara n’Ijipt, Jekob na umu-ya ndikom: ọkpara Jekob, bú Reuben.

9 Umu-ndikom Reuben; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami.

10 Umu-ndikom Simeon; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoba, na Shaul, bú nwa nke nwayi Kenean ahu.

11 Umu-ndikom Livai; Giashon, na Kohat, na Merari.

12 Umu-ndikom Juda; Ia, na Onan, na Shila, na Perez, na Zera: ma Ia na Onan nwuru n’ala Kenean. Umu-ndikom Perez bu kwa Hezron, na Hamul.

13 Umu-ndikom Isaka; Tola, na Puva, na Job, na Shimron.

14 Umu-ndikom Zebulun: Sered, na Ilon, na Jahleel.

15 Ndia bu umu-ndikom Lia, nke ọ muru nye Jekob nime Padan-eram, ha na Daina, bú nwa-ya nwayi nkpuru-obi nile nke umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom bu orú na iri na atọ

16 Umu-ndikom Gad; Zifyon, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Iri, na Arodi, na Areli.

17 Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi: umu-ndikom Beria kwa; Heba na Malkiel.

18 Ndia bu umu-ndikom Zilpa, onye Leban nyere Lia nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia, bú nkpurui-obi iri na isi.

19 Umu-ndikom Rechel, bú nwunye Jekob; Josef na Benjamin.

20 Ewe muara Josef n’ala Ijipt Manase na Efraim, ndi Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya.

21 Umu-ndikom Benjamin; Bela na Beka, na Ashbil, na Gira, na Neaman, na Ihi, na Rosh, na Mupim, na Hupim, na Ad.

22 Ndia bu umu-ndikom Rechel, ndi amuru nye Jekob: nkpuru-obi nile di iri na anọ.

23 Umu-ndikom Dan; Hushim.

24 Umu-ndikom Naftali; Jahzeel, na Guni, na Jiza, na Shilem.

25 Ndia bu umu-ndikom Bilha, onye Leban nyere Rechel nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia: nkpuru-obi nile di asa.

26 Nkpuru-obi nile Jekob nwere ndi batara n’Ijipt, ndi siri n’úkwù-ya puta, nāgughi nwunye nile nke umu Jekob, nkpuru-obi nile di ọgu atọ na isi;

27 umu-ndikom Josef, ndi amuru nye ya n’Ijipt, di kwa nkpuru-obi abua; nkpuru-obi nile nke ulo Jekob, ndi nābata n’Ijipt, di ọgu atọ na iri.

28 Ma ọ bu Juda ka o zigara n’iru ya jekuru Josef, igosi ya uzọ n’iru ya rue Goshen; ha we bata n’ala Goshen

29 Josef we dozie ub͕o-ala-ya, rigorue Goshen izute Israel, bú nna-ya; ọ me ka ọ hu ya anya, ọ we dakwasi ya n’olu, kwa ákwá n’olu-ya mb͕e di anya.

30 Israel we si Josef, Ka m’nwua ub͕u a, mb͕e m’husiri iru-gi, na i nọ ndu rue ub͕u a.

31 Josef we si umu-nne-ya, si kwa ulo nna-ya, M’gārigo, gosi Fero, si ya, Umu-nnem na ulo nnam, ndi nọ n’ala Kenean, abiakutewom;

32 ma ndikom ahu bu ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu, n’ihi na ndi ọlu-ha bu iche anu-ulo ka ha bu-woro; ọ bu kwa ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, ka ha chitaworo.

33 Ma o gēru, mb͕e Fero gākpọ unu, si kwa, Gini bu ọlu unu nālu?

34 na unu gāsi, Ndi ọlu-ayi bu iche anu-ulo ka ndi orù-gi buworo site na mb͕e ayi di na nwata we rue ub͕u a, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà: ka unu we biri n’ala Goshen; n’ihi na onye ọ bula nāzù ìgwè ewu na aturu bu ihe-árú n’anya ndi Ijipt.

Categories
JENESIS

JENESIS 47

1 Josef we ba, gosi Fero, si, Nnam na umu-nnem, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, esiwo n’ala Kenean bia; ma, le, ha nọ n’ala Goshen.

2 O we si n’etiti umu-nne-ya nile chiri ndikom ise, guzo ha n’iru Fero.

3 Fero we si umu-nne-ya, Gini bu ọlu unu nālu? Ha si Fero, Ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu ka ndi-orù-gi bu, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà.

4 Ha we si Fero, Inọ dika ọbìa n’ala nka ka ayi biaworo; n’ihi na ọ dighi ihe eji azù ìgwè ewu na aturu ahu nke ndi-orù-gi nwere; n’ihi na oké unwu a di arọ́ n’ala Kenean: ub͕u a kwa, biko, ka ndi-orù-gi biri n’ala Goshen.

5 Fero we gwa Josef okwu, si, Nna-gi na umu-nne-gi abiakutewo gi:

6 ala Ijipt, n’iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n’ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n’ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n’etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m’nwere.

7 Josef we me ka Jekob nna-ya bata, o guzo ya n’iru Fero: Jekob we gọzie Fero.

8 Fero we si Jekob, Ùbọchi arọ ndu-gi di ole?

9 Jekob we si Fero, Ubọchi arọ nke ọnọdu-ọbìam nile di ọgu arọ isi na iri: ha di ole-na-ole, jọ kwa njọ, bú ubọchi arọ ndum, ha erughi kwa ubọchi arọ ndu nke nnam-hà n’ubọchi ọnọdu-ọbia-ha.

10 Jekob we gọzie Fero, si n’iru Fero pua.

11 Josef we me ka nna-ya na umu-nne-ya biri n’ala, ọ nye kwa ha ihe-onwunwe n’ala Ijipt, n’ebe kachasi nma nke ala ahu, n’ala Rameses, dika Fero nyere iwu.

12 Josef were nri zùa nna-ya, na umunne ya, na ulo nile nke nna-ya, dika ọnu-ọgugu nke umu-ntakiri si di.

13 Nri adighi n’ala ahu nile; n’ihi na oké unwu ahu di arọ́ nke-uku, ala Ijipt na ala Kenean we nāda mbà n’ihi oké unwu ahu.

14 Josef we chikọta ego nile anāchọta n’ala Ijipt, na n’ala Kenean, n’ọnọdu ọka ndi ahu nāzu: Josef we chita ego ahu n’ulo Fero.

15 Ego we gwu-chapu n’ala Ijipt, na n’ala Kenean, ndi Ijipt nile we biakute Josef, si, Nye ayi nri, n’ihi gini ka ayi nānwu n’iru gi? n’ihi na ego agwuwo.

16 Josef we si, Nyenu anu-ulo-unu; ka m’nye kwa unu nri n’ọnọdu anu-ulo-unu, ma ọ buru na ego agwu.

17 Ha we chiri anu-ulo-ha biakute Josef: Josef we nye ha nri n’ọnọdu inyinya-ha, na n’ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ewu na aturu, na n’ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ehi, na n’ọnọdu inyinya-ibu-ha, we were nri nāzù ha n’arọ ahu n’ọnọdu anu-ulo-ha nile.

18 Arọ ahu we gwu, ha we bia-kute ya n’arọ nke-abua, si ya, Ayi agaghi-ezonari onye-nwem, na ọ buru na ego agwusia, ọ buru kwa na onye-nwem nwere anu-ulo, bú anumanu-ayi, ọ dighi ihe fọduru n’iru onye-nwem, ma-ọbughi aru-ayi na ala-ayi:

19 n’ìhi gini ka ayi nānwu n’anya-gi, ma ayi, ma ala-ayi? zuru ayi na ala-ayi n’ọnọdu nri, ayi onwe-ayi na ala-ayi gāghọ-kwa-ra Fero ndi-orù: gi nye kwa ayi nkpuru-ọghigha, ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu, ka ala we ghara kwa itọb͕ọrọ n’efù.

20 Josef we zutara Fero ala Ijipt nile; n’ihi na ndi Ijipt rere ọhia-ha, onye ọ bula ọ re nke ya, n’ihi na oké unwu ahu siri ike n’aru ha: ala ahu we ghọ ihe Fero nwere.

21 Ma ndi ahu, ọ mere ka ha gabiga ba n’obodo nile site n’otu nsọtu ókè-ala Ijipt rue nsọtu-ya ọzọ.

22 Nání ala ndi-nchu-àjà ka ọ nāzu-tagh: n’ihi na ndi-nchu-àjà nwere òkè nri sitere n’ebe Fero nọ, ha ri-kwa-ra òkè-nri-ha nke Fero nyere ha; n’ihi nka ha ereghi ala-ha.

23 Josef we si ndi ahu, Le, azutawom unu na ala-unu nye Fero ta: le, unu gēnwe nkpuru-ọghigha, unu gāgha kwa nkpuru n’ala.

24 O gēru kwa, n’ọmume-ya, na unu gēnye Fero ọtù uzọ n’uzọ ise, uzọ anọ aburu kwa ihe unu nwere, ibu nkpuru-ọghigha nke ubi, na ibu ihe-oriri-unu, na iburu ndi nọ n’ulo-unu ihe-oriri, na iburu umu ntakiri-unu ihe-oriri.

25 Ha si, I debewo ayi ndu: ka ayi huta amara n’iru onye-nwem, ayi gāghọrọ Fero ndi-orù.

26 Josef we me ya ka ọ buru ukpuru bayere ala nke Ijipt rue ta, na Fero gēnwe otù uzọ n’uzọ ise; nání ala ndi-nchu-àjà nwere iche nāghọghi ihe Fero nwere.

27 Israel we biri n’ala Ijipt, n’ala Goshen; ha we nwe ihe-onwunwe nime ya, mu kwa ọmùmù, ba uba nke-uku.

28 Jekob we di ndu n’ala Ijipt arọ iri na asa: ubọchi Jekob, bú arọ ndu-ya, we di ọgu arọ asa na asa.

29 Ubọchi Israel gānwu we rue nso: ọ kpọ nwa-ya Josef, si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n’iru gi, biko, tiye aka-gi n’okpuru apata-ukwum, me-kwa-ram ebere na ezi-okwu; biko, elìlam n’Ijipt:

30 kama mu na nnam-hà gēdina, i gēsi kwa n’Ijipt bupum, lìkwam n’ílì-ha. Ọ si, Mu onwem gēme dika okwu-gi si di.

31 Ọ si, Ṅuaram iyi: o we ṅuara ya iyi. Israel we kpọ isi ala n’elu ihe-ndina-ya.

Categories
JENESIS

JENESIS 48

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na otù onye siri Josef, Le, nna-gi nāria ọria: o we chiri umu-ya ndikom abua ka ha so ya je, bú Manase na Efraim.

2 Otù onye we gosi Jekob, si, Le, nwa-gi Josef nābiakute gi: Israel we jisie ike, nọdu n’elu ihe-ndina-ya.

3 Jekob we si Josef, Chineke Nke puru ime ihe nile mere ka m’hu Ya anya na Luz n’ala Kenean, Ọ gọziem,

4 sim, Le, M’nēme gi ka i mua ọmùmù, M’gēme kwa gi ka i ba uba, M’gēme kwa gi ka i ghọ nkpọkọta ndi di iche iche; M’gēnye kwa nkpuru-gi gānọchi gi ala nka, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi.

5 Ma ub͕u a umu-gi ndikom abua, ndi amuru nye gi n’ala Ijipt tutu mu abiakute gi n’Ijipt, nkem ka ha bu; Efraim na Manase, dika Reuben na Simeon, gābu ndi m’nwere.

6 Ma umu-gi, ndi i musoworo ha, ọ bu gi nwe ha; n’aha umu-nne-ha ka agākpọ ha n’ihe-nketa-ha.

7 Ma mu onwem, mb͕e m’siri na Padan bia, Rechel nwuru n’akukum n’ala Kenean n’uzọ, mb͕e uzọ foduru ibiaru Efrat: m’we lìe ya n’ebe ahu n’uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem).

8 Israel we hu umu-ndikom Josef, ọ si Òle ndi bu ndia?

9 Josef we si nna-ya, Umum ka ha bu, ndi Chineke nyeworom n’ebe a. Ọ si, Biko, chitaram ha, m’gāgọzi ha.

10 Ma anya Israel di arọ́ site n’agadi ọ bu, ọ pughi ihu uzọ. O me ka ha biakute ya nso; o we sutu ha ọnu, b͕akua ha.

11 Israel we si Josef, Echeghm ihu iru-gi: ma, le, Chineke emewo ka m’hu kwa nkpuru-gi.

12 Josef we me ka ha puta n’etiti ikperè-ya abua: ọ kpọ isi ala, kpuchie iru-ya n’ala.

13 Josef we chiri ha abua, Efraim n’aka-nri-ya n’ebe aka-ekpe Israel di, na Manase n’aka-ekpe-ya n’ebe aka-nri Israel di, ọ we me ka ha biakute ya nso.

14 Israel we setia aka-nri-ya tukwasi ya n’isi Efraim, onye bu nke-ntà, na aka-ekpe-ya n’isi Manase, nātub͕a aka-ya abua; n’ihi na Manase bu ọkpara.

15 Ọ we gọzie Josef, si, Chineke ahu, Nke nnam-hà, bú Abraham na Aisak, nējeghari n’iru Ya, Chineke ahu Nke nāzùm ogologo ogem rue taa,

16 Mọ-ozi ahu Nke nāb͕aputam n’aka ihe ọjọ nile, Ya gọzie umu-okoro ndia; ka akpọ kwa n’isi ha aha nkem, na aha nnam-hà, bú Abraham na Aisak; ka ha ba kwa uba rue ọtutu madu n’etiti uwa.

17 Josef we hu na nna-ya nātukwasi aka-nri-ya n’isi Efraim, ọ we jọ njọ n’anya-ya: ọ we welie aka nna-ya, iwepu ya n’isi Efraim tiye n’isi Manase.

18 Josef we si nna-ya, Ọ bughi otú a, nnam: n’ihi na nka bu ọkpara; tukwasi aka-nri-gi n’isi-ya.

19 Nna-ya we ju, si, Amawom, nwam, amawom: ya onwe-ya gāghọ kwa otù ndi, ya onwe-ya gādi kwa uku: ma otú ọ di, nwa-nne-ya nke-ntà gādi uku kari ya, nkpuru-ya gāghọ kwa ùjú nke mba nile.

20 Ọ we gọzie ha n’ubọchi ahu, si, Nime gi ka Israel gāgọzi, si, Chineke me gi ka i di ka Efraim, ka i di kwa ka Manase: ọ we do Efraim n’iru Manase.

21 Israel we si Josef, Le, mu onwem gaje inwu: ma Chineke gānọyere unu, me kwa ka unu lata n’ala nna-unu-hà.

22 Mu onwem enyewo kwa gi otù akuku ugwu kari umu-nne-gi, nke m’ji mma-agham, ji kwa utam, nara n’aka ndi-Amorait.

Categories
JENESIS

JENESIS 49

1 Jekob we kpọ umu-ya ndikom òkù, si: Chikọtanu onwe-unu, ka m’we gosi unu ihe gādakwasi unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.

2 Zukọnu, nukwanu, umu-ndikom Jekob;

Genu nti n’olu Israel, bú nna-unu.

3 Reuben, ọkparam ka i bu, ikem, na nkpuru mbu nke umem;

Ọkaka nke nbuli-elu, na ọkaka nke ike.

4 I nāb͕oghari dika miri, akarila akari;

N’ihi na i rigoro n’ihe-ndina nna-gi:

Mb͕e ahu i mere ya ka ọ ghara idi nsọ: ọ rigoro n’utem.

5 Simeon na Livai bu nwa-nne;

Ihe nke ihe-ike bu mma-agha-ha.

6 Abala n’ìzù-ha, nkpuru-obim;

Gi na nkpọkọta-ha abula otù, nsọpurum;

N’ihi na n’iwe-ha ka ha b͕uru nwoke,

Ọ bu kwa n’ime ihe nātọ ha ka ha bipuru nkwonkwo-ukwu ehi.

7 Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n’ihi na ọ di ike;

Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n’ihi na o sika ike:

M’gēkesa ha nime Jekob,

B͕asa kwa ha n’Israel.

8 Juda, gi onwe-gi, umu-nne-gi gēkele gi:

Aka-gi di n’olu ndi-iro-gi;

Umu-ndikom nna-gi gākpọ isi ala nye gi.

9 Nwa-ọdum ka Juda bu;

N’anu adọb͕uru, nwam, ka i siworo rigo;

O ruru ala, ọ makpuru dika ọdum,

Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?

10 Nkpa-n’aka eze agaghi-esi n’ebe Juda nọ wezuga onwe-ya,

Nkpa-n’aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n’etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya,

Rue mb͕e Shailo gābia;

Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.

11 O nēlibe nwa-inyinya-ibu-ya n’osisi vine,

O nēlibe kwa nwa nke nne-inyinya-ibu-ya n’osisi vine kachasi nma;

Ọ suworo uwe-ya nime manya-vine,

Su kwa ákwà-nb͕okwasi-ya n’ọbara nkpuru-vine:

12 Anya-ya abua nācha ọbara-ọbara site na manya-vine,

Ezé-ya nēnwu kwa ọcha site na miri-ara-ehi.

13 Zebulun, n’ọnu-miri nke oké osimiri ka o gēbi:

Ya onwe-ya gānọ kwa n’ọnu-miri nke ub͕o.

Akuku-ya gādi kwa n’akuku Zaidon.

14 Isaka bu inyinya-ibu di ike,

Nāmakpuru n’etiti ogige-aturu abua:

15 Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma,

Hu kwa ala ahu, na ọ di uto;

Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu,

We ghọ onye nēfè òfùfè orù.

16 Dan gēkpeputa ndi-ya,

Dika otù nime ebo nile nke Israel.

17 Ka Dan buru agwọ n’uzọ,

Aju-ala n’okporo-uzọ,

Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru,

Onye o nēbu we daghachi azu.

18 Nzọputa-Gi ka m’cheworo, Jehova

19 Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya:

Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n’ikiri-ukwu.

20 Asha ka abuba si aputa, bú nrí-ya,

Ya onwe-ya gēnye kwa ihe-utọ di iche iche nke eze.

21 Naftali bu nne-ele arapuworo arapu:

Bú onye ahu nke nēnye okwu-ọnu nile di utọ.

22 Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu,

Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n’akuku isi-iyi;

Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi.

23 Ndi-ọ̀kà-uta mere ya ihe-ilú,

B͕a kwa ya àkú, kpọ kwa ya asì:

24 Ma uta-ya nānọgide n’idi-ike,

Ab͕a-kwa-ra ogwe-aka-ya abua ume,

Site n’aka Dike nke Jekob,

(N’ebe ahu ka onye-ọzùzù-aturu si bia, bú nkume Israel,)

25 Site na Chineke nke nna-gi; Ya yere gi aka!

Na Onye Nke puru ime ihe nile; Ya gọzie gi!

Ngọzi nile nke elu-igwe site n’elu,

Ngọzi nile nke ob͕u-miri nke nāma-kpu n’okpuru,

Ngọzi nile nke ara na nke àkpà-nwa.

26 Ngọzi nile nke nna-gi

Adiwo ike kari ngọzi nile nke ndi murum

Rue ókè nke ugwu ebighi-ebi:

Ha gādi n’isi Josef,

Na n’opù-n’isi nke onye ekewapuru n’etiti umu-nne-ya.

27 Benjamin bu wolf nke nādọb͕u anu:

N’ututu o nēri anu ọ dọb͕uru,

N’anyasi o nēkesa kwa ihe ọ kwatara.

28 Ndia nile bu ebo Israel iri na abua: nka bu kwa ihe nna-ha gwara ha, ọ we gọzie ha; onye ọ bula n’ihe nke di ka ngọzi-ya si di, otú a ka ọ gọziri ha.

29 Ọ we nye ha iwu, si ha, Anāchikọta mu onwem na ndi nkem n’ala-mọ: lìenum n’ebe nnam-hà di n’ọb͕à nke di n’ọhia nke Efron, bú onye Het,

30 n’ọb͕à nke di n’ọhia Makpila, nke di n’iru Mamre, n’ala Kenean, nke Abraham zutara, ya na ọhia ahu, n’aka Efron onye Het, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì:

31 n’ebe ahu ka ha lìri Abraham na Sera nwunye-ya; n’ebe ahu ka ha lìri Aisak na Rebeka nwunye-ya; ọ bu kwa n’ebe ahu ka m’liri Lia:

32 azutara ọhia ahu na ọb͕à ahu nke di nime ya n’aka umu Het.

33 Jekob we nyebie umu-ya ndikom iwu, chikọta ukwu-ya n’ihe-ndina-ya, kubie ume, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n’ala-mọ.

Categories
JENESIS

JENESIS 50

1 Josef we dakwasi n’iru nna-ya, kwakwasi ya ákwá, sutu kwa ya ọnu.

2 Josef we nye ndi-orù-ya, bú ndi-dibia, iwu ib͕asì ozu nna-ya; ndi-dibia ahu we b͕asì ozu Israel.

3 Ewe debezuere ya ọgu ubọchi abua: n’ihi na otú a ka anēdebezu ubọchi ndi anāb͕asì ozu-ha: ndi Ijipt we kwara ya ákwá ọgu ubọchi atọ na iri.

4 Ubọchi ikwara ya ákwá we gabiga, Josef we gwa ulo Fero okwu, si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n’iru unu, biko, kwuenu na nti Fero, si.

5 Nnam merem ka m’ṅua iyi, si, Le, mu onwem gaje inwu: n’ílìm nke m’doziworo onwem n’ala Kenean, n’ebe ahu ka i gēlìm. Ma ugbua, biko, ka m’rigo, lìe nnam, lata.

6 Fero we si, Rigo, lìe nna-gi, otú o mere gi ka i ṅua iyi.

7 Josef we rigo ilì nna-ya: ndi-orù Fero nile, na ndi-okenye ulo-ya, na ndi-okenye nile nke ala Ijipt,

8 na ulo Josef nile, na umu-nne-ya, na ulo nna-ya, we so ya rigo: nání umu-ntakiri-ha, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, ka ha rapuru n’ala Goshen.

9 Ma ub͕o-ala ma ndi inyinya nēbu we so ya rigo: ọmuma-ulo-ikwū ahu we di oké uku.

10 Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n’ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n’obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n’obi n’ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa.

11 Ndi bi n’ala ahu, bú ndi Kenean, we hu oruru-újú ahu n’ebe-nzọcha-ọka nke Atad, ha si, Nka buru ndi Ijipt oruru-újú di arọ́: n’ihi nka akpọrọ aha-ya Ebel-Mizraim, nke di n’ofè Jọdan.

12 Umu-ya ndikom we mere ya otú a dika ọ nyere ha iwu:

13 umu-ya ndikom we bubata ya n’ala Kenean, lìe ya n’ọb͕a nke ọhia Makpila, nke Abraham zutara, ya na ọhia, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì, n’aka Efron onye-Het, n’iru Mamre.

14 Josef we laghachi n’Ijipt, ya onwe-ya, na umu-nne-ya, na ndi nile soro ya rigo ilì nna-ya, mb͕e o lìsiri nna-ya.

15 Ma mb͕e umu-nne Josef huru na nna-ha anwuruwo, ha si, Eleghi anya Josef gākpọ ayi asì, ọ gēnyeghachi kwa ayi n’ùjú ihe ọjọ nile ayi mere ya.

16 Ha we nye otù onye iwu n’ebe Josef nọ, si, Nna-gi nyere iwu tutu ọnwu-ya, si,

17 Otú a ka unu gāsi Josef, Ariọm i, biko, b͕aghara njehie umu-nne-gi, na nmehie-ha, n’ihi na ọ bu ihe ọjọ ka ha meworo gi: ub͕u a kwa, biko, b͕aghara njehie ndi-orù Chineke nke nna-gi. Josef we kwa ákwá mb͕e ha gwara ya okwu.

18 Umu-nne-ya we je kwa, da n’ala n’iru ya, si, Le, ayi gāburu gi ndi-orù.

19 Josef we si ha, Unu atula egwu: n’ihi na ọ̀ bu n’ọnọdu Chineke ka m’nọ?

20 Unu onwe-unu kwa, unu chere ihe ọjọ megidem; Chineke chere ya ka ọ buru ezi ihe, ime dika ọ di ta, idebe ọtutu ndi ndu.

21 Ma ub͕u a unu atula egwu: mu onwem ganāzù unu na umu-ntakiri-unu. Ọ we kasie ha obi, gwa ha okwu nāba ha n’obi.

22 Josef we biri n’Ijipt, ya onwe-ya, na ulo nna-ya. Josef we di ndu ọgu arọ ise na iri.

23 Josef we hu umu Efraim nke umu-umu nke-atọ: amu-kwa-ra umu Makia nwa Manase n’ikperè abua nke Josef.

24 Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem gaje inwu: ma Chineke gēleta unu n’ezie, me ka unu si n’ala nka rigorue ala ahu nke Ọ ṅuru Abraham na Aisak iyi bayere ya.

25 Josef we me ka umu Israel ṅua iyi, si, Chineke gēleta unu n’ezie, unu gēsi kwa n’ebe a bugo ọkpukpum.

26 Josef we nwua, ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri: ha we b͕asì ozu-ya etiye ya n’ib͕e n’Ijipt.