Categories
ILU

ILU 1

1 Ilu di iche iche nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel:

2 Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti;

Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta;

3 Inara idọ-aka-na-nti nke inwe-uche,

Na ezi omume na ikpé na izi-ezi;

4 Inye ndi nēnweghi uche ezi uche,

Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù:

5 Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n’amam-ihe-ya;

Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu:

6 Ighọta ilu, na okwu miri emi;

Okwu nile nke ndi mara ihe, na okwu-omimi nile ha.

7 Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma:

Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n’uche ledaworo anya.

8 Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi,

Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

9 N’ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi,

Ihe-inya-n’olu ka ha gāburu olu-gi.

10 Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà,

Ekwela.

11 Ọ buru na ha asi, Soro ayi je,

Ka ayi che anwu ọbara,

Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n’efu;

12 Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ,

Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n’olùlù;

13 Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta,

Ayi gākwaju ulo-ayi nile n’ihe ayi kwatara n’agha;

14 Nzà-gi ka i gēfe n’etiti ayi;

Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ:

15 Nwam, esola ha je n’uzọ;

B͕ochie ukwu-gi n’iga n’okporo-uzọ-ha:

16 N’ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ,

Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara.

17 N’ihi na ọ bu n’efu ka anāb͕asa ub͕u,

N’anya nnunu ọ bula:

18 Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu,

Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.

19 Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di;

Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu.

20 Amam-ihe nēti nkpu n’èzí;

N’amá nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà;

21 N’isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù;

N’oghere ọnu-uzọ-ama nile,

N’obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile:

22 Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n’anya?

Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike?

Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì?

23 Laghachinu n’iba-nbam:

Le, m’gāwupuru unu mọm,

M’gēme ka unu mara okwum nile.

24 N’ihi na akpọwom òkù, unu we ju;

Esetipuwom akam, ma ọ dighi onye nāṅa nti;

25 Unu we wezuga ndum-ọdum nile,

Unu achọghi kwa iba-nbam:

26 Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m’gāchì ọchì;

M’gākwa emò mb͕e oké egwu-unu nābia;

27 Mb͕e oké egwu-unu nābia dika ikuku siri ike,

Mb͕e nhuju-anya-unu nābiaru kwa dika oké ifufe;

Mb͕e ahuhu na nkpà nābiakwasi unu.

28 Mb͕e ahu ka ha gākpọkum, ma m’gaghi-aza;

Ha gāchọsim ike, ma ha agaghi-achọtam:

29 N’ihi na ha kpọrọ ihe-ọmuma asì,

Na n’ihi na ọ bughi egwu Jehova ka ha rọputara:

30 Ha achọghi ndum-ọdum;

Ha lelìri iba-nbam nile:

31 Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha,

Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ.

32 N’ihi na nchighari-azu nke ndi nēnweghi uche gēb͕u ha,

Ọ bu kwa inọ-n’udo nke ndi-nzuzu gēme ka ha la n’iyì.

33 Ma onye nēgem nti gēbi na ntukwasi-obi,

Ọ gānọ kwa jū nātughi oké egwu ihe ọjọ.

Categories
ILU

ILU 2

1 Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile,

Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m’nyere n’iwu n’ebe i nọ;

2 Itọrọ amam-ihe nti-gi n’ala,

We wezuga obi-gi inwe nghọta;

3 E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku,

Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;

4 Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha,

Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:

5 Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova,

Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.

6 N’ihi na Jehova nēnye amam-ihe;

N’ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:

7 O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe,

Ọ bu ọta ndi nēje ije n’izu-okè nwere;

8 Iche okporo-uzọ nile nke ikpé,

Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.

9 Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé,

Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.

10 N’ihi na amam-ihe gābà n’obi-gi,

Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;

11 Ìzùzù ganēche gi nche,

Nghọta gēchebe gi:

12 Inaputa gi n’uzọ onye ọjọ,

N’aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;

13 Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi,

Ka ha we je ije n’uzọ nile nke ọchichiri;

14 Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ,

Ha nēteghari egwú ọṅù n’ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ;

15 Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ,

Ha nēsihie kwa n’uzọ nile ha:

16 Inaputa gi n’aka nwayi nābughi nwunye-gi,

N’aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;

17 Nke nārapu di o nwere n’ab͕ọghọ,

Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:

18 N’ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu,

Ọ bu kwa uzọ iridaru n’ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu.

19 Ndi nile ndi nābakuru ya, ha adighi-alata,

Ha adighi-eru kwa okporo-uzọ nile nke ndu:

20 Ka i we je ije n’uzọ ndi di nma,

Debe kwa okporo-uzọ nile nke ndi ezi omume.

21 N’ihi na ndi ziri ezi gēbi n’uwa,

Ndi zuru okè gāfọdu kwa nime ya.

22 Ma ndi nēmebi iwu ka agēbipu n’uwa,

Ọ bu kwa ndi nāghọ aghughọ ka agēropu na ya.

Categories
ILU

ILU 3

1 Nwam, echezọla iwum;

Ma ka obi-gi chebe ihe nile m’nyere n’iwu:

2 N’ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu,

Na udo, ka ha gātukwasiri gi.

3 Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi:

Ke ha n’olu-gi;

De ha n’elu mbadamba nkume, bú obi-gi:

4 Chọta kwa amara na ezi uche

N’anya Chineke na madu.

5 Tukwasi Jehova obi-gi nile,

Adabere-kwa-la nghọta-gi:

6 N’uzọ-gi nile mara Ya,

Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.

7 Abula onye mara ihe n’anya gi onwe-gi;

Tua egwu Jehova, we si n’ihe ọjọ wezuga onwe-gi:

8 Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi,

Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile.

9 Sọpuru Jehova site n’àkù-gi,

Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile:

10 Ọba-gi nile gējuputa kwa n’ihe-nriju-afọ,

Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu.

11 Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova:

Ike agwu-kwa-la gi n’iba-nba-Ya:

12 N’ihi na onye Jehova nāhu n’anya ka Ọ nābara nba;

Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.

13 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu,

Ya na madu nke nēnweputa nghọta.

14 N’ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha,

Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma.

15 Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby:

Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya.

16 Ubọchi ndu di ogologo di n’aka-nri-ya;

N’aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di.

17 Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ,

Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.

18 Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka:

E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.

19 Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa;

O doziri elu-igwe site na nghọta.

20 Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile,

Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi.

21 Nwam, ekwela ka ha si n’anya-gi abua wezuga onwe-ha;

Chebe nzube-ihe na ìzùzù;

22 Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu,

Bu-kwa-ra olu-gi amara.

23 Mb͕e ahu ka i ganēje ije n’uzọ-gi na ntukwasi-obi,

I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,

24 Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu:

E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.

25 Atula egwu site n’oké egwu mberede,

Ma-ọbu site n’ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:

26 N’ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi,

Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.

27 Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri,

Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.

28 Asila madu-ibe-gi, Je, lata,

Echi ka m’gēnye gi;

Mb͕e ọ di n’aka-gi.

29 Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi,

Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.

30 Gi na madu esela okwu n’efu,

Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ.

31 Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo,

Arọputa-kwa-la otù efu n’uzọ-ya nile.

32 N’ihi na ihe-árú n’anya Jehova ka onye sihiere esihie bu:

Ma n’aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.

33 Ọbubu-ọnu Jehova di n’ulo onye nēmebi iwu;

Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi.

34 Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò,

Ma ọ bu ndi di ume-ala n’obi ka Ọ nēnye amara.

35 Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa;

Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.

Categories
ILU

ILU 4

1 Umum, nurunu idọ-aka-na-ntí nke nna,

Tọ-kwa-nu nti n’ala ima nghọta:

2 N’ihi na ezi ihe-nmuta ka m’nyeworo unu;

Unu arapula iwum.

3 N’ihi na nwa ka m’buru nnam,

Di nrò, buru kwa nwa enwere nání ya n’iru nnem.

4 O we zím ihe, sim,

Ka obi-gi jide okwum nile;

Debe ihe nile m’nyere n’iwu, we di ndu:

5 Nweta amam-ihe, nweta nghọta;

Echezọla, esi-kwa-la n’okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi:

6 Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi;

Hu ya n’anya, ọ gēchebe kwa gi.

7 Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe:

E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta.

8 Tukọba ya elu, o gēbuli kwa gi:

Ọ gāsọpuru gi, mb͕e i nāb͕aku ya obi.

9 Ọ gēnye isi-gi okpu amara:

Okpu-eze mara nma ka ọ gēnye gi n’aka.

10 Nuru, nwam, nara kwa okwu-ọnum nile;

Arọ ndu gāba-kwa-ra gi uba.

11 N’uzọ amam-ihe ka m’zíworo gi ihe;

Emewom ka i zọ ije n’uzọ nile nke izi-ezi.

12 Mb͕e i nēje ije, agaghi-akpagide nzọ-ukwu-gi;

Ọ buru kwa na i b͕a ọsọ, i gaghi-asu ngọngọ.

13 Jide idọ-aka-na-nti aka; arala ya aka:

Chebe ya; n’ihi na ya onwe-ya bu ndu-gi.

14 Abàla n’okporo-uzọ ndi nēmebi iwu,

Aga-kwa-la n’iru n’uzọ ndi ọjọ.

15 Zere ya, agabigala nime ya;

Wezugara ya onwe-gi, gabiga.

16 N’ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ;

Anapuwo kwa ura-ha n’ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ.

17 N’ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu,

Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu.

18 Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu,

Nke nāmu aga n’iru n’iru rue mb͕e chi bọchara.

19 Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri:

Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ.

20 Nwam, ṅa nti n’okwum nile;

Tọ nti-gi n’ala n’okwu-ọnum nile.

21 Ekwela ka ha si n’anya-gi abua wezuga onwe-ha;

Debe ha n’etiti obi-gi.

22 N’ihi na ndu ka ha buru ndi nachọta ha,

Ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile.

23 Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi;

N’ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.

24 Si n’ebe i nọ wezuga ọnu nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ,

Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n’ebe i nọ.

25 Ka anya-gi abua legide n’iru,

Ka mbubere-anya-gi lezi kwa n’iru gi.

26 Me ka okporo-uzọ nke ukwu-gi abua di lari,

Ka edozi kwa uzọ-gi nile.

27 Ewezugala onwe-gi n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe:

Si n’ihe ọjọ wezuga ukwu-gi.

Categories
ILU

ILU 5

1 Nwam, ṅa nti n’amam-ihem;

Tọ nti-gi n’ala nye nghọtam:

2 Ka i we debe ìzùzù di iche iche,

Ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi we chebe kwa ihe-ọmuma.

3 N’ihi na eb͕ub͕ere-ọnu nke nwayi nābughi nwunye-gi nābusi manu-aṅu,

Ihe kwọrọ murumuru kari manu ka okpo-ọnu-ya di kwa:

4 Ma ikpe-azu-ya nēlu ilu dika wormwood,

Ọ di nkọ dika mma-agha iru abua.

5 Ukwu-ya abua nārida n’ọnwu;

Ala-mọ ka nzọ-ukwu-ya nile nējidesi ike;

6 Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari:

Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha.

7 Ma ub͕u a, umum, gēnum nti,

Unu esi-kwa-la n’okwu nile nke ọnum wezuga onwe-unu.

8 Me ka uzọ-gi di anya n’ebe ọ nọ,

Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso:

9 Ka i we ghara inye ndi ọzọ ebube-gi,

Ka i we ghara kwa inye onye nēnweghi obi-ebere arọ-gi nile:

10 Ka afọ we ghara iju ndi nābughi ndi nke gi n’ume-gi;

Ka ihe nile i dọb͕uru onwe-gi n’ọlu inweta we ghara kwa idi n’ulo onye nābughi nke gi;

11 I we sua udè n’ikpe-azu-gi,

Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi,

12 I we si, Le ka m’siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku,

Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya;

13 Egeghkwam nti n’olu ndi-ozizim,

Ọ bughi kwa n’ebe ndi nēzím ihe nọ ka m’tọworo ntim n’ala!

14 Ọ fọduru ihe ntà ka m’nọzue n’ihe ọjọ nile

N’etiti nkpọkọta na nzukọ ndi nkem.

15 Ṅua miri sitere n’olùlù nke aka gi,

Na miri nērù erù site n’ime olùlù-miri nke aka gi.

16 Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n’èzí?

Ọ̀ bu n’amá ka iyi miri gāwasasi?

17 Ka ha diri nání gi onwe-gi,

Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha.

18 Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi;

Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n’okorọbia.

19 Dika nne-ele nke nāhu n’anya na nne-ewu-ọhia mara nma,

Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile;

Nání n’ihu-n’anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile.

20 Ma n’ìhi gini ka i gēji nwayi nābughi nwunye-gi waghari, nwam?

N’ìhi gini ka i gāb͕aku nwayi nābughi nwunye-gi obi?

21 N’ihi na n’iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di,

Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari.

22 Ajọ omume nile nke aka ya gānwude onye ahu nēmebi iwu,

Agēji kwa udọ̀ nile nke nmehie-ya jidesie ya ike.

23 Onye ahu gānwu nānaraghi idọ-aka-na-nti;

Ọ bu kwa n’iba-uba nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ka ọ nāwaghari.

Categories
ILU

ILU 6

1 Nwam, ọ buru na i nọworo madu-ibe-gi na mbe,

Ọ buru na i narawo onye ala ọzọ n’aka ibu onye-mbe,

2 Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi ma gi n’ọnyà,

Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi nwude gi.

3 Me nka ub͕u a, nwam, we naputa onwe-gi,

N’ihi na i bàwo n’ọbu-aka nke madu-ibe-gi;

Je, kwe ka azọtọ gi n’ukwu, riọchie madu-ibe-gi nti.

4 Enyela anya-gi abua ura,

Enye-kwa-la mbubere-anya-gi irù-ura.

5 Naputa onwe-gi dika mb͕ada n’aka onye-ntá,

Na dika nnunu n’aka osi-ọnyà.

6 Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu;

Le uzọ-ya nile, we mara ihe:

7 Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n’ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi,

8 Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku,

Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi.

9 Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu?

Òle mb͕e ka i gēsi n’ura-gi bilie?

10 Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà,

Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala;

11 Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe,

Ihe-ukọ-gi kwa dika nwoke ji ọta.

12 Madu nke jọb͕uru onwe-ya, onye nēme ajọ ihe;

O ji ọnu nke nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ ejeghari;

13 O nēb͕u iku-anya-ya, o ji ukwu-ya abua ekwu okwu,

O ji nkpisi-aka-ya nile nēzí ihe.

14 Ib͕akuta Chineke azu di n’obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile:

Ọ nēzisa ise-okwu.

15 N’ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede;

N’otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.

16 Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì;

E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya:

17 Anya di elu, na ire okwu-ugha,

Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;

18 Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe,

Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n’ihe ọjọ;

19 Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume,

Na onye nēzisa ise-okwu n’etiti umu-nne.

20 Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n’iwu,

Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

21 Hie ha n’obi-gi mb͕e nile,

Ke ha n’olu-gi.

22 Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi;

Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi;

Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka.

23 N’ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n’iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè;

Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:

24 Idebe gi ka i pua n’aka nwayi ọjọ,

N’aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi.

25 Achọsila ima-nma-ya ike n’obi-gi;

Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya.

26 N’ihi na ọ bu n’ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha:

Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia.

27 Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n’uwe obi-ya,

Ma uwe-ya agaghi-ere ọku?

28 Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n’elu icheku-ọku,

Ma ọku agaghi-aru ya n’ukwu-ya abua?

29 Otú a ka onye nābakuru nwunye madu-ibe-ya di;

Agaghi-agu onye ọ bula nke nēmetu nwayi ahu aka n’onye nēmeghi ihe ọjọ.

30 Madu adighi-eleda onye-ori anya, mb͕e o nēzu ori

Imeju nkpuru-obi-ya mb͕e agu nāgu ya:

31 Ma asi na achọta ya, ọ gākwughachi okpukpu asa;

Àkù nile nke ulo-ya ka ọ gēnye.

32 Onye nākwa nwayi iko, obi amam-ihe kọrọ ya:

Onye nēmebi nkpuru-obi nke aka ya ka onye nēme ya bu.

33 Ọnyá-ntiputa na nlelì ka ọ gāhu;

Ita-uta-ya kwa, agaghi-ehichapu ya.

34 N’ihi na ekworo bu ọnuma nke nwoke;

Ọ gaghi-enwe ọmiko n’ubọchi ọ́bọ̀.

35 Ọ gaghi-ahu ihe-ikpuchi-nmehie ọ bula iru ọma;

Ọ gaghi-ekwe kwa, mb͕e i gēme ka ihe-iri-ngo ba uba.

Categories
ILU

ILU 7

1 Nwam, debe okwu-ọnum nile,

Zobe ihe nile m’nyere n’iwu n’ebe i nọ.

2 Debe ihe nile m’nyere n’iwu, we di ndu,

Debe kwa iwum dika nwa-anya nke anya-gi.

3 Ke ha na nkpisi-aka-gi nile;

De ha n’elu mbadamba nkume, bú obi-gi.

4 Si amam-ihe, Nwa-nnem nwanyi ka i bu;

Kpọ kwa nghọta nwanyi i mara nke-ọma:

5 Ka ha we debe gi ka i pua n’aka nwanyi nābughi nwunye-gi,

N’aka nwanyi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ.

6 N’ihi na na window nke ulom

N’oghere-inara-ifufem ka m’lepuru anya;

7 M’we hu n’etiti ndi nēnweghi uche,

M’mata n’etiti umu-ndikom,

Otù nwa-okorọbia nke obi amam-ihe kọrọ,

8 Ka ọ nāgabiga n’amá na nso nkuku nwanyi ahu,

Ọ bu kwa n’uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije;

9 Na chi-ojiji, n’anyasi nke ubọchi,

Nime nb͕achi nke abali na ọchichiri.

10 Ma, le, otù nwanyi zutere ya

Yiri uwe nke nwanyi nākwa iko, ọ bu kwa onye echeworo obi-ya.

11 Onye nēme nkpọtu ka ọ bu, buru kwa onye nēwezuga onwe-ya;

Ọ bughi n’ulo-ya ka ukwu-ya nānọ:

12 Ub͕u a n’èzí ka ọ nọ, ub͕u a ọ bu n’amá nile,

Ọ bu kwa na nso nkuku nile ọ bula ka ọ nēche anwu.

13 Nwanyi ahu we jide ya aka, sutu kwa ya ọnu,

Were iru ihere nādighi si ya:

14 Ihe àjà nile nke àjà-udo di n’akam;

Ta ka m’kwughachiworo ihe nile m’kwere na nkwa.

15 N’ihi nka ka m’putara izute gi,

Ichọsi iru-gi ike, m’we chọputa gi.

16 Ákwà-nb͕abá mara nma ka m’b͕abáworo n’ihe m’ji edina,

Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt.

17 Ewerewom myrrh na aloes na cinnamon

Fesa ihe-ndinam.

18 Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n’ikwa-iko rue ututu;

Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n’ihu-n’anya nile.

19 N’ihi na dim anọghi n’ulo,

O jewo ije di anya:

20 Ọ werewo akpa ego n’aka-ya;

N’ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata.

21 O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n’ulo-ya,

O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya.

22 Nwa-okorọbia ahu nējeso ya na mberede,

Dika ehi si abia n’ob͕ub͕u-ya,

Ma-ọbu dika nkpọrọ-ukwu si abia n’idọ-aka-na-nti nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ya;

23 Rue mb͕e àkú gēji b͕apue imeju-ya;

Dika nnunu si eme ngwa ibà n’ib͕udu,

Ma ọ maghi na imegide ndu-ya ka ọ bu.

24 Ma ub͕u a, umum, genum nti,

Tọ-kwa-nu nti n’ala n’okwu nile nke ọnum.

25 Ekwela ka obi-gi wezuga onwe-ya ba n’uzọ nile nke nwanyi ahu,

Akpafula n’okporo-uzọ-ya nile.

26 N’ihi na ọ di ọtutu ndi emeruru aru ka o meworo ka ha da:

E, ndi nwere ume ka ndi-ya nile eb͕uru eb͕u bu.

27 Uzọ nile nke ala-mọ ka ulo-ya bu,

Nāridaru ime-ulo nke ọnwu.

Categories
ILU

ILU 8

1 Amam-ihe, ọ̀ dighi-akpọ òkù?

Nghọta kwa, ọ̀ dighi-eme ka olu-ya da udà?

2 N’elu ebe nile di elu n’akuku uzọ,

N’ab͕ata uzọ nile, ka O guzoworo onwe-ya;

3 N’akuku ọnu-uzọ-ama nile, n’ọnu amá obodo,

Na nbata ọnu-uzọ nile, ka ọ nētisi nkpu ike, si,

4 Ọ bu unu, madu, ka m’nākpọku;

Olum nādaku kwa umu madu.

5 Unu ndi nēnweghi uche, ghọtanu ezi uche;

Unu ndi-nzuzu kwa, menu ka obi-unu ghọta ihe.

6 Nurunu, n’ihi na isi ihe di iche iche ka m’nēkwu;

Nsaghe eb͕ub͕ere-ọnum gābu kwa ihe di iche iche ziri ezi.

7 N’ihi na ezi-okwu ka okpo-ọnum nēkwu dika onye nātughari uche;

Ọzọ, ihe-árú nke eb͕ub͕ere-ọnum ka nmebi-iwu bu.

8 N’ezi omume ka okwu nile nke ọnum di;

Ọ dighi ihe nēzighi ezi ma-ọbu ihe b͕agọrọ ab͕agọ di nime ha.

9 Ha nile putara ìhè n’ebe onye-nghọta nọ,

Ha zi-kwa-ra ezi n’ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ.

10 Nara idọ-aka-na-ntim, anara-kwa-la ọla-ọcha;

Nara kwa ihe-ọmuma kari ọla-edo ọma arọputara arọputa.

11 N’ihi na amam-ihe di nma kari ruby;

Ihe nile kwa nke nātọ madu utọ, ha agaghi-ara ka ya.

12 Mu onwem, bú amam-ihe, emewo ezi uche ebe-obibim,

Ọ bu kwa ọmuma ihe-ìzùzù di iche iche ka m’nāchọputa.

13 Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì:

Npako, na nganga, na uzo ọjọ,

Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m’kpọworo asì.

14 Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe:

Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike.

15 Mu ka ndi-eze ji abu eze,

Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume.

16 Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi,

Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa.

17 Mu onwem nāhu ndi ahu n’anya, bú ndi nāhum n’anya;

Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam.

18 Àkù na nsọpuru di n’akam;

E, àkù nke nādigide na ezi omume.

19 Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha;

Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa.

20 N’uzọ ezi omume ka m’nēje ije,

N’etiti okporo-uzọ nile nke ikpé:

21 Ime ka ndi nāhum n’anya keta ihe di adi,

Ka m’we meju kwa ulo-àkù nile ha.

22 Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya,

Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu.

23 Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m’guzosie ike, site n’isi-mbu,

Tutu uwa adi.

24 Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram;

Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri.

25 Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n’ala,

Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram:

26 Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo,

Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi.

27 Mb͕e O doziri elu-igwe, n’ebe ahu ka m’nọ:

Mb͕e O nyere ukpuru, si, Ka ihe b͕ara buruburu dikwasi n’iru ob͕u-miri:

28 Mb͕e Ọ mere ka mbara-ígwé sie ike n’elu:

Mb͕e emere ka isi-iyi nile nke ob͕u-miri di ike:

29 Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya,

Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya:

Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru:

30 Anọkwam n’akuku Ya, dika onye-ọ̀kà:

M’we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi,

Nēgwuri egwú n’iru Ya mb͕e nile;

31 Nēgwuri egwú n’elu-uwa dum madu bi n’uwa-Ya;

Ihe nātọm utọ di kwa n’ebe umu madu nọ.

32 Ma ub͕u a, umum, genum nti:

N’ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.

33 Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe,

Unu eze-kwa-la ya ndu.

34 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu,

N’imu anya n’akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi,

Niche nche n’akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile.

35 N’ihi na onye nāchọtam achọtawo ndu,

Ọ gēnweputa kwa n’aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.

36 Ma onye nēmehie megidem nēme nkpuru-obi-ya ihe-ike:

Ndi nile nke nākpọm asì nāhu ọnwu n’anya.

Categories
ILU

ILU 9

1 Amam-ihe ewuwo ulo-ya,

Ọ waputawo ogidi asa ya:

2 O b͕uwo anu-ob͕ub͕u-ya; ọ gwawo manya-vine-ya agwa;

O dowo kwa table-ya n’usoro.

3 O zipuwo umu-ab͕ọghọ-ya, ọ nākpọ òkù

N’elu ebe nile di elu nke obodo, si,

4 Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n’ebe a:

Onye obi amam-ihe kọrọ, amam-ihe asiwo ya,

5 Bianu, rienu nrim ufọdu,

Ṅu-kwa-nu manya-vine ufọdu nke m’gwaworo agwa.

6 Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu;

Ga-kwa-nu n’iru n’uzọ nghọta.

7 Onye nādọ onye nākwa emò aka na nti nēwetara onwe-ya nlelì:

Ọzọ, onye nābara onye nēmebi iwu nba nēwetara onwe-ya ọlu-ya.

8 Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì:

Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n’anya.

9 Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari:

Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n’amam-ihe-ya.

10 Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu:

Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta.

11 N’ihi na site na mu ka ubọchi-gi gāba uba,

Agātukwasi-kwa-ra gi arọ ndu.

12 Ọ buru na i mara ihe, i maworo onwe-gi ihe:

Ọ buru kwa na i kwa emò, nání gi gēbu ya.

13 Nwanyi nzuzu nēme nkpọtu;

Onye nēnweghi uche ka ọ bu, ọ maghi kwa ihe ọ bula.

14 Ọ nānọdu kwa n’ọnu-uzọ ulo-ya,

N’elu oche n’ebe nile di elu nke obodo,

15 Ikpọ ndi nāgabiga n’uzọ òkù,

Bú ndi nāgazi agazi n’okporo-uzọ-ha,

16 Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n’ebe a:

Ọzọ, onye obi amam-ihe kọrọ, nwanyi ahu asiwo ya,

17 Miri ezutara ezuta nātọ utọ,

Nri eriri na nzuzo di utọ.

18 Ma nwoke ahu amaghi na ndi nādighi ndu nọ n’ebe ahu;

Na ọ bu n’ebe nile miri emi nke ala-mọ ka ndi ọ kpọrọ nọ.

Categories
ILU

ILU 10

1 Ilu di iche iche nke Solomon.

Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria:

Ma nwa di nzuzu bu iru-újú nne-ya.

2 Àkù nke nmebi-iwu adighi-aba urù:

Ma ezi omume nānaputa n’ọnwu.

3 Jehova agaghi-ekwe ka agu gub͕ue nkpuru-obi onye ezi omume:

Ma ọchichọ nke ndi nēmebi iwu nāchọsi ike ka Ọ nākwapu.

4 Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu:

Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.

5 Onye nēkpokọta na mb͕e okpom-ọku bu nwa nēnwe uche:

Ma onye nāraru ura n’owuwe-ihe-ubi bu nwa nēweta ihere.

6 Ngọzi nile nādiri isi onye ezi omume:

Ma ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.

7 Ncheta anēcheta onye ezi omume bu ihe-ngọzi:

Ma aha ndi nēmebi iwu gēre ure.

8 Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n’iwu:

Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n’eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

9 Onye nēje ije n’izu-okè nēje na ntukwasi-obi:

Ma onye nēme ka uzọ-ya nile b͕agọ ab͕agọ, agāmara ya.

10 Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta:

Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n’eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

11 Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu:

Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.

12 Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche:

Ma njehie nile ka ihu-n’anya nēkpuchi.

13 N’eb͕ub͕ere-ọnu nke onye nāghọta ihe ka anāchọta amam-ihe:

Ma nkpa-n’aka diri azu onye obi amam-ihe kọrọ.

14 Ndi mara ihe nākpakọba ihe-ọmuma:

Ma ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ya bu nbibi di nso.

15 Àkù nke ọgaranya bu obodo-ya siri ike:

Nbibi nke ndi nēnweghi ike bu ob͕eye ha bu.

16 Ọlu onye ezi omume nēdubà na ndu;

Ihe-omume nke onye nēmebi iwu nēdubà na nmehie.

17 Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu:

Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue.

18 Onye nēkpuchi ikpọ-asì nwere eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha;

Ọzọ, onye nēme ka akukọ ọjọ puta, onye ahu bu onye-nzuzu.

19 N’ọtutu okwu njehie adighi-akwusi:

Ma onye nēb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye nwere uche.

20 Ọla-ọcha arọputara arọputa ka ire onye ezi omume bu:

Obi ndi nēmebi iwu di ka ihe ntà.

21 Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu:

Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ha nānwu n’ihi na obi amam-ihe kọrọ ha.

22 Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya,

Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.

23 Ọ diri onye-nzuzu dika igwuri-egwú, bú ime ihe-nzube ọjọ:

Otú a ka amam-ihe di-kwa-ra onye-nghọta.

24 Ihe onye nēmebi iwu nātu ujọ ya, nke ahu gābiakute ya:

Ma ihe ndi ezi omume nāchọsi ike ka agēnye ha.

25 Mb͕e oké ifufe nēfebiga, onye nēmebi iwu anọghi kwa:

Ma onye ezi omume bu ntọ-ala ebighi-ebi.

26 Dika manya b͕ara uka si adi n’ebe ezé di, na dika anwuru-ọku si adi n’ebe anya di,

Otú a ka onye-ume-ngwu nādi n’ebe ndi nēzì ya ozi nọ.

27 Egwu Jehova nātukwasi ubọchi na ndu madu:

Ma arọ nile nke ndi nēmebi iwu gādi nkpunkpu.

28 Nchere ndi ezi omume gābu ọṅù:

Ma olile-anya ndi nēmebi iwu gāla n’iyì.

29 Ebe siri ike n’ebe onye zuru okè nọ ka uzọ Jehova bu;

Ma ọ bu nbibi n’ebe ndi nālu ajọ ihe nọ.

30 Agaghi-ewezuga onye ezi omume n’ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi:

Ma ndi nēmebi iwu agaghi-ebi n’uwa.

31 Ọnu onye ezi omume nāmi amam-ihe dika nkpuru:

Ma ire nke nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, agēbipu ya.

32 Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume mara ihe nātọ utọ:

Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu.