Categories
II. TIMỌTI

II. TIMỌTI 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n’ọchichọ nke Chineke, dika nkwa nke ndu ahu nke di nime Kraist Jisus si di,

2 nēdegara Timọti akwukwọ, bú nwam nke m’huru n’anya: Amara na ebere na udo diri gi, nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.

3 Anameleke Chineke, Onye m’nēkpere site na nnam ochie-hà n’akọ-na-uche di ọcha, otú nchetam bayere gi n’aririọm nile di n’ewepughi aka,

4 n’ihi na agu ihu gi nāgusim ike abali na ehihie, ebe m’nēcheta anya-miri-gi nile, ka m’we juputa n’ọṅù;

5 ebe emerem ka m’cheta okwukwe iru-abua nādighi ya nke di nime gi; bú okwukwe nke buru uzọ biri nime nne-gi ochie Lois na nne-gi Yunaisi; ma emerem ka m’kweye na o bi kwa nime gi.

6 Ọ bu kwa n’ihi ihe a ka m’nēchetara gi ka i me ka onyinye-amara nke Chineke nwuru ọku, bú nke di nime gi site n’ibikwasi aka abua nkem n’isi-gi.

7 N’ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè.

8 Ya mere ka ihere àmà nke Onye-nwe-ayi, ma-ọbu ihere nke mu onye-nkpọrọ-Ya, ghara ime gi: kama so ozi ọma Ya hujukọ anya dika ike nke Chineke si di;

9 Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi,

10 ma emere ka ọ puta ìhè ub͕u a site na ngosi nke Onye-nzọputa-ayi Kraist Jisus, Onye mere ka ọnwu ghara idi ìrè, site kwa n’ozi ọma Ya weputa ndu na emebighi-emebi n’ìhè,

11 bú ozi ọma nke edoro mu onwem ka m’buru onye-nkwusa, na onye-ozi, na onye-ozizí, izisa ya.

12 Ọ bu kwa n’ihi ihe a ka m’nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n’ihi na amataram Onye m’kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m’kweye na Ọ puru iche ihe m’nyere n’aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu.

13 Jide ihe ilere anya nke okwu nēnye ezi ndu nke i nuru n’ọnum, nime okwukwe na ihunanya nke di nime Kraist Jisus.

14 Ihe ọma ahu nke enyere n’aka-gi idebe, were Mọ Nsọ Nke bi nime ayi nēche ya.

15 I matara nka, na ndi nile di n’Esia b͕akutaram azu; ndi Faigelọs na Hamọgenis di n’etiti ha.

16 Ka Onye-nwe-ayi mere èzí-na-ulo Ọnisifọrọs ebere: n’ihi na o mere ka m’nwe ume ndu ọtutu mb͕e, ihere nkpọrọm emeghi kwa ya;

17 kama, mb͕e ọ biaruru Rom, o were inu-ọku-n’obi chọbam, we chọtam

18 (ka Onye-nwe-ayi nye ya ka ọ chọta ebere n’aka Onye-nwe-ayi n’ubọchi ahu); ka ha ra kwa, bú ihe o ji jere m ozi n’Efesọs, gi onwe-gi jere karia.

Categories
II. TIMỌTI

II. TIMỌTI 2

1 Ya mere, gi onwe-gi, nwam, ka eme ka i di ike n’amara nke di nime Kraist Jisus.

2 Ihe nile i nukwara n’ọnum site n’etiti ọtutu ndi-àmà, nye ihe ndia n’aka madu ndi kwesiri ntukwasi-obi idebe, bú madu ndi ọ gēkwe kwa izí madu-ibe-ha ihe ndia.

3 Som hujukọ anya, dika onye-agha ọma nke Kraist Jisus.

4 Ọ dighi onye-agha ọ bula nātuhi onwe-ya n’ihe nke ibi-obi a mb͕e o nēbu agha; ka o we me ihe gātọ onye dere aha-ya n’akwukwọ dika onye-agha.

5 Ma ọ buru kwa na onye ọ bula nāb͕a nb͕a, ekpughi ya okpu-nmeri, ma ọ buru na ọ b͕aghi nb͕a otú ọ di n’iwu.

6 Onye-ọlu-ubi nke nādọb͕u onwe-ya n’ọlu aghaghi ibu uzọ kère òkè na nkpuru-ya.

7 Nātughari uche n’ihe m’nēkwu; n’ihi na Onye-nwe-ayi gēnye gi nghọta n’ihe nile.

8 Nēcheta Jisus Kraist, dika Onye emeworo ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye si na nkpuru Devid puta, dika ozi ọmam si di:

9 nke m’nāhuju anya nime ya rue ab͕u, dika onye nālu ọlu ọjọ; ma ekeghi okwu Chineke ab͕u.

10 N’ihi nka ka m’nwere ntachi-obi n’ihe nile n’ihi ndi arọputara, ka ha onwe-ha we ru kwa nzọputa nke di nime Kraist Jisus, ya na ebube ebighi-ebi.

11 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi: N’ihi na asi na ayi soro Ya nwukọ ọnwu, ayi gēso kwa Ya dikọ ndu:

12 asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze: asi na ayi gāgọnari Ya, Ya onwe-ya gāgọnari kwa ayi:

13 asi na ayi ekweghi ekwe, Ya onwe-ya nānọgide n’ikwesi ntukwasi-obi; n’ihi na Ọ pughi igọnari Onwe-ya.

14 Nēchetara ha ihe ndia, nāgwasi ha ike n’iru Onye-nwe-ayi, ka ha ghara ise okwu bayere okwu efu, bú ihe nābaghi n’ihe, nēkpù ndi nānu anu iru.

15 Nānu ọku n’obi iche onwe-gi n’iru madu dika onye Chineke nwaputaworo, onye-ọlu nke ihere nāpughi ime ya, onye nēkwuzi okwu nke ezi-okwu ahu.

16 Ma nēze okwu efu nile emeruru emeru: n’ihi na ha gāga kari n’iru n’asọpurughi-Chineke,

17 okwu-ha gābu kwa ọnyá nāba aba dika gangrene: ndi Haimeniọs na Filitọs di n’etiti ha;

18 bú madu ndi hiere n’ihe bayere ezi-okwu ahu, nāsi na nbilite-n’ọnwu agabigawo ub͕u a, ha nēkpù kwa okwukwe madu ufọdu iru.

19 Otú ọ di, ntọ-ala di ike nke Chineke nēguzo, ebe o nwere akàrà nka, Onye-nwe-ayi mara ndi bu nke Ya: na, Ka onye ọ bula nke nākpọ aha Onye-nwe-ayi si n’ajọ omume wezuga onwe-ya.

20 Ma nime ulo uku ọ bughi nání ihe ọla-edo na ihe ọla-ọcha di, kama ihe osisi na ihe ájá di kwa; e mekwara ufọdu ka ha buru ihe-nsọpuru, me kwa ufọdu ha na buru ihe-ihere.

21 Ya mere ọ buru na onye ọ bula asacha onwe-ya pua n’ihe ndia, ọ gābu ihe emere ka ọ buru ihe-nsọpuru, ihe edoworo nsọ, ihe bara n’ihe ka Onye-nwe-ya were ya me ihe, ihe edoziworo iji lu ezi ọlu nile ọ bula.

22 Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n’anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n’obi di ọcha.

23 Ma nāju iju-ajuju nzuzu na nke amaghi-ihe, ebe i matara na ha nāmuputa ilu-ọ̀gù.

24 Ma orù nke Onye-nwe-ayi aghaghi ibu onye nādighi-alu ọ̀gù, kama ọ ghaghi idi nwayọ n’ebe madu nile nọ, ọ ghaghi kwa ibu onye nwere ike izí ihe, onye nānagide ihe ọjọ,

25 n’idi-nwayọ nādọ ndi nēdo onwe-ha imegide ya aka na nti; ma asi na ọ bu ezie ma eleghi anya na Chineke gēnye ha nchèghari ka ha we mazu ezi-okwu,

26 we teta n’ura manya pua n’ọnyà ekwensu, ebe orù Onye-nwe-ayi nwudeworo ha na ndu ka ha me ihe Chineke nāchọ.

Categories
II. TIMỌTI

II. TIMỌTI 3

1 Ma mara nka, na oge di oké egwu gābia na mb͕e ikpe-azu.

2 N’ihi na madu gābu ndi nāhu nání onwe-ha n’anya, ndi nāhu ego n’anya, ndi nānya isi, ndi-npako, ndi-nkwulu, ndi nēkweyeghi ndi muru ha, ndi nēnweghi ekele, ndi nādighi ọcha n’obi,

3 ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nādighi-ab͕a ndu, ndi nēbo ebubo ugha, ndi nādighi-ejide onwe-ha, ndi di ka anu-ọhia, ndi nādighi-ahu ezi ihe n’anya,

4 ndi nārara madu nye n’aka ndi-iro-ha, ndi-isi-ike, ndi afuliworo elu, ndi nāhu ihe-utọ n’anya kama ihu Chineke n’anya;

5 ndi nēnwe udi nke nsọpuru-Chineke, ma ha agọwo ike-ya: gi b͕akuta kwa ndia azu.

6 N’ihi na ha sitere na ndia, bú ndi nēb͕ebà nime ulo di iche iche, nādọta kwa ndinyom nēnweghi uche n’agha, bú ndi ekpokwasiworo ha nmehie, ndi agu ihe ọjọ di iche iche dufuworo,

7 ndi nāmu ihe mb͕e nile, ma ha apughi ibiaru imazu ezi-okwu mb͕e ọ bula.

8 Ma otù uzọ ahu Janis na Jambris guzogidere Moses, otú a ka ndia nēguzogide kwa ezi-okwu ahu; bú madu ndi mebiworo n’uche, ndi ajuru aju n’ihe bayere okwukwe-ayi.

9 Ma ha agaghi-aga n’iru kari: n’ihi na enweghi-uche-ha gāputasi ìhè nye madu nile, dika enweghi-uche nke ndi ahu putakwara.

10 Ma gi onwe-gi soro ozizím, omumem, ihe m’zubere, okwukwem, ogologo-ntachi-obim, ihu-n’anyam, ntachi-obim,

11 nsob͕um nile, ahuhum nile; aha ihe dakwasirim n’Antiọk, n’Aikọniọm, na Listra; aha nsob͕u m’nagidere: Onye-nwe-ayi dọputa-kwa-ram nime ha nile.

12 E, agēsob͕u kwa ndi nile ndi nāchọ idi ndu n’uzọ isọpuru Chineke nime Kraist Jisus.

13 Ma ajọ madu nile na ndi-aghughọ gānaga n’iru n’ijọkari njọ, nēduhie ndi ọzọ, anēduhie kwa ha.

14 Ma gi onwe-gi, nọgide nime ihe nile i mutara, nke eme-kwa-ra ka i kwere ha, ebe i matara madu ndi i mutara ha n’ọnu-ha;

15 ebe i ma-kwa-ra na i sitere n’oge i di na nwa ọhu mata ihe di nsọ nile edeworo n’akwukwọ nsọ nke puru ime ka i buru onye-amam-ihe inata nzọputa site n’okwukwe nke i kwere na Kraist Jisus.

16 Ihe ọ bula edeworo n’akwukwọ nsọ bu ihe si n’obi Chineke puta, ọ ba-kwa-ra urù iji zí ihe, na iji tu madu nmehie-ha n’anya, na iji me ka uche madu guzozie, na iji zùputa nzùputa nke di n’ezi omume:

17 ka onye nke Chineke we zue okè, onye emeworo ka o zue okè ilu ezi ọlu nile ọ bula.

Categories
II. TIMỌTI

II. TIMỌTI 4

1 Anamagwasi gi ike n’iru Chineke na Kraist Jisus, Onye gaje ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpé, ewerekwam ngosi-Ya na ala-eze-Ya si gi;

2 kwusa okwu-Ya; tukwasi uche n’ọlu-gi n’oge kwesiri, ma-ọbu n’oge nēkwesighi; tu madu nmehie-ha n’anya, ba nba, riọ aririọ, n’ogologo-ntachi-obi nile na ozizí nile.

3 N’ihi na oge gādi mb͕e ha agaghi-anagide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu; kama, ebe ha nwere nti nākọ ọkọ, ha gēkpokwasi ndi-ozizí nye onwe-ha dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di;

4 ha gēchighari kwa nti-ha ka ha ghara inu ezi-okwu, ma ha gējehie ṅa nti akukọ-irò.

5 Ma gi onwe-gi, nēnwe anya-udo n’ihe nile, huju anya, lua ọlu nke onye nēzisa ozi ọma, jezu ozi-gi.

6 N’ihi na anāwusim ub͕u a dika àjà-ihe-ọṅuṅu, oge ulam eruwo kwa.

7 Ab͕asiwom nb͕a ọma ahu, ab͕asiwom ọsọ ahu, edebesiwom okwukwe ahu:

8 nke fọduru bu na edebeworom okpu-eze nke ezi omume ahu, nke Onye-nwe-ayi, bú Onye ezi omume n’ikpe ikpé, gēnyeghachim n’ubọchi ahu: ma ọ bughi nání mu onwem, kama Ọ gēnyeghachi kwa ndi nile huworo ngosi-Ya n’anya.

9 Were inu-ọku-n’obi biakutem ọsọsọ:

10 n’ihi na Dimas rapuru náním, ebe ọ huru oge di ub͕u a n’anya, o we ga Tesalọnaika; Kresens gara Galetia, Taitọs gara Dalmetia.

11 Nání Luk nọyerem. Kuru Mak, duru ya ka o so gi onwe-gi bia: n’ihi na ọ bu onye baram n’ihe ijerem ozi.

12 Ma ezigaram Tikikọs n’Efesọs.

13 Uwe nāchu oyi nke m’rapuru na Troas n’aka Kapọs, weta ya mb͕e i gābia, ya na akwukwọ nile, ma nke kachasinu, weta akwukwọ parchment nile.

14 Aleksanda onye nākpu ọlà merem ọtutu ihe ọjọ: Onye-nwe-ayi gēnyeghachi ya ihe dika ọlu-ya nile si di:

15 gi onwe-gi nēche kwa onye ahu nche; n’ihi na o guzogidere okwu-ayi nke-uku.

16 Na ngọpum mbu ọ dighi onye ọ bula nọ n’akukum, kama madu nile rapuru náním: ka aghara igu ya n’isi-ha.

17 Ma Onye-nwe-ayi guzorom nso, we me ka m’di ike; ka ewe were ọnum kwusazue nkwusa ahu, ka ndi mba ọzọ nile we nu kwa: ewe dọputam n’ọnu ọdum.

18 Onye-nwe-ayi gādọputam n’ajọ ọlu nile ọ bula, Ọ gāzọputakwam ka m’bata n’ala-eze-Ya di n’elu-igwe: Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

19 Kele Priska na Akwila, na èzí-na-ulo Ọnisifọrọs.

20 Erastọs nọgidere na Kọrint: ma arapurum Trọfimọs nime Militọs, aru adighi ya ike.

21 Were inu-ọku-n’obi bia tutu mb͕e oyi erue. Yubulọs nēkele gi, ya na Pudins, na Lainọs, na Klọdia, na umu-nna-ayi nile.

22 Ka Onye-nwe-ayi nọyere mọ nke gi. Ka amara dinyere unu.