Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 21

1 Oké unwu we di n’ubọchi Devid arọ atọ n’usoro, arọ na arọ; Devid we chọ iru Jehova. Jehova we si, Ọ bu n’ihi Sọl na n’ihi ulo ọbara ya, n’ihi na o mere ka ndi Gibeon nwua.

2 Eze we kpọ ndi Gibeon, si ha; (ma ndi Gibeon, ọ bughi n’umu Israel ka ha sitere, kama ha sitere na ndi-Amorait fọduru; ma umu Israel ṅuru ha iyi: ma Sọl chọrọ itib͕u ha n’ekworo n’ihi umu Israel na Juda:)

3 Devid we si ndi Gibeon, Gini ka m’gēmere unu? gini kwa ka m’gēji kpuchie nmehie, ka unu we gọzie ihe-nketa Jehova?

4 Ndi Gibeon we si ya, Ọ dighi ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo diri ayi n’ebe Sọl nọ, ma-ọbu n’ebe ulo-ya nọ: ọ dighi kwa nwoke ọ bula agēme ka ọ nwuara ayi n’Israel. O we si, Ihe unu onwe-unu nāsi, ihe ahu ka m’gēmere unu.

5 Ha we si eze, Nwoke ahu nke mere ka ayi gwusia, nke zube-kwa-ra imegide ayi, ewe kpochapu ayi ka ayi ghara iguzo onwe-ayi n’ókè-ala ọ bula nke Israel,

6 ka enye ayi ndikom asa sitere n’umu-ya, ayi gākwuba kwa ha nye Jehova nime Gibea Sọl, onye Jehova rọputara. Eze we si, Mu onwem gēnye unu ha.

7 Ma eze nwere ọmiko n’aru Mefiboshet, nwa Jonatan nwa Sọl, n’ihi ọṅuṅu-iyi Jehova nke di n’etiti ha, bú n’etiti Devid na Jonatan nwa Sọl.

8 Eze we chiri umu-ndikom abua nke Rizpa nwa-nwayi Aia, ndi ọ muru Sọl, bú Amoni na Mefiboshet; na umu-ndikom ise nke Maikal nwa-nwayi Sọl, ndi ọ muru Adriel nwa Bazilai onye Mehola:

9 o we nye ha n’aka ndi Gibeon, ha we kwuba ha n’ugwu n’iru Jehova: ha asa we da n’otù: ma emere ka ndi ahu nwua n’ubọchi owuwe-ihe-ubi, n’ubọchi mbu, na nmalite obìbì ọka barley.

10 Rizpa nwa-nwayi Aia we chiri ákwà-nkpe, b͕asara onwe-ya n’elu oké nkume, site na nmalite owuwe-ihe-ubi rue mb͕e esi n’elu-igwe wukwasi ha miri-ozuzo; o kweghi kwa ka anu-ufe nke elu-igwe nọkwasi ha n’ehihie, ma-ọbu anu-ọhia n’abali.

11 Ewe gosi Devid ihe Rizpa nwa Aia, nwayi bu iko Sọl, mere.

12 Devid we je chiri ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya n’aka ndi-nwe Jebesh-gilead, ndi zupuru ha n’amá Bet-shan, ebe ndi Filistia kwubara ha, n’ubọchi ndi Filistia tib͕uru Sọl nime Gilboa:

13 o we si n’ebe ahu chigota ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya; ha chikọta-kwa-ra ọkpukpu ndi akwubara.

14 Ha we lìe ọkpukpu Sọl na Jonatan nwa-ya n’ala Benjamin nime Zela, n’ílì Kish, bú nna-ya: ha we me ihe nile eze nyere n’iwu. Ewe riọta Chineke aririọ bayere ala ahu mb͕e ihe a gasiri.

15 Ma ndi Filistia nwere agha ọzọ ha nēbuso Israel; Devid we rida, ya na ndi-orù-ya, buso ndi Filistia agha; Devid we da #mbà.

16 Ishbi-benob, nke di n’etiti umu Rafa, onye ọtùtù ube-ya di ọgu shekel ọla iri-na-ise n’ọtùtù, ekewo-kwa-ra onye ahu ihe-agha ọhu, o we si na ya gētib͕u Devid.

17 Ma Abishai nwa Zeruaia yere ya aka, tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua. Mb͕e ahu ndikom Devid ṅuru ya iyi, si, I gaghi eso ayi pua ibu agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel.

18 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha di kwa ọzọ na Gob nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Saf, nke di n’etiti umu Rafa.

19 Agha we di ọzọ na Gob ebusoro ndi Filistia; Elhanan nwa Jaare-oregim onye Bet-lehem we tib͕ue nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà.

20 Agha we di ọzọ na Gat, ma otú nwoke toro ogologo nọ n’ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ọnu-ọgugu-ha di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa.

21 Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimai, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya.

22 Madu anọ ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n’aka Devid, na site n’aka ndi-orù-ya.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 22

1 Devid we gwa Jehova okwu nile nke abù a n’ubọchi Jehova naputara ya n’ọbu-aka ndi-iro-ya nile na n’ọbu-aka Sọl:

2 ọ we si,

Jehova bu oké nkumem, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m’b͕apu, Onye m’nwere;

3 Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya;

Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam;

Onye-nzọputam, I nāzọputam n’ihe-ike.

4 Onye-anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova,

Ewe zọputam n’aka ndi-irom.

5 N’ihi na ebili-miri nke ọnwu b͕aram buruburu,

Miri-iyi nile nke jọb͕uru onwe-ya nēme ka m’tua egwu.

6 Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu;

Ọnyà nile nke ọnwu biara n’irum.

7 Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam,

Ọ bu Chinekem ka m’nākpọku:

O we si n’ulo uku Ya nu olum,

Nkpu m’tikuru Ya ba-kwa-ra na nti-Ya abua.

8 Ala we me nkpatu ma kwa jijiji,

Nto-ala nile nke elu-igwe nāma jijiji,

Ewe me ka ha me nkpatu, n’ihi na iwe-Ya di ọku.

9 Anwuru-ọku rigoro n’imi-Ya,

Ọku nēsi kwa n’ọnu-Ya ripia:

Afunwuru icheku site na ya.

10 O rulata-kwa-ra elu-igwe, rida;

Oké ọchichiri di kwa n’okpuru ukwu-Ya abua.

11 O we nọkwasi n’elu cherub dika inyinya, we fere:

Ewe hu Ya n’elu nkù ìfùfè.

12 O we do ọchichiri buruburu Ya ka ọ buru ulo-ntu,

Bú nchikọta miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.

13 Site n’onwunwu nke nēnwu n’iru Ya

Afunwuru icheku ọku.

14 Jehova si n’elu-igwe nāma éb͕è-elu-igwe,

Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa-ka olu-Ya da.

15 O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;

Àmùmà kwa, O we chusa ha.

16 Ewe hu ebe osimiri si erù,

Anēkpughe ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi,

N’ibasi-nba-ike nke Jehova,

Site n’ume nke iku-ume nke imi-Ya.

17 O si n’elu zìe, kurum,

Dọputam n’ọtutu miri;

18 Ọ nānaputam n’aka onye-irom di ike,

N’aka ndi nākpọm asì; n’ihi na ha nwere ume karim

19 Ha nābia n’irum n’ubọchi nhuju-anyam:

Ma Jehova burum ihe-ndabere.

20 O we me ka m’puta rue ebe sara mbara:

Ọ nādọputam, n’ihi na ihem tọrọ Ya utọ.

21 Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di:

Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ.

22 N’ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova,

Emebighkwam iwu n’ipu n’aka Chinekem.

23 N’ihi na ikpé-Ya nile di n’irum:

Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga onwem n’ebe ha di.

24 M’we zue okè n’ebe Ọ nọ,

Edebe-kwa-ram onwem pua n’ajọ omumem.

25 Jehova we meghachim dika ezi omumem si di;

Dika idi-ọcham n’anya-Ya si di.

26 N’ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere,

N’ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;

27 N’ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;

Ma n’ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á.

28 I gāzọputa kwa ndi ewedara n’ala:

Ma anya-Gi abua dikwasi ndi di elu, ka I we me ka ha di ala.

29 N’ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova:

Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.

30 N’ihi na m’nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe:

Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi.

31 Chineke, uzọ-Ya zuru okè:

Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;

Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.

32 N’ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?

Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?

33 Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku:

Ọ nākwazu kwa uzọm.

34 O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:

N’elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam.

35 O nēzí akam abua ibu agha;

Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.

36 I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:

Ume-ala-n’obi nke Gi nēmekwam ka m’ba uba.

37 I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n’okpurum,

Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.

38 Ka m’chua ndi-irom, we kpochapu ha;

Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.

39 M’we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa:

Ha we da n’okpuru ukwum abua.

40 I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:

I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n’okpurum.

41 Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha,

Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.

42 Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha;

N’ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha.

43 Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala,

Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.

44 I we me ka m’b͕apu n’ilu-ọ̀gù nile nke ndim;

I nēdebem ka m’buru isi mba nile ọzọ: Ndi m’nāmaghi gēfèm òfùfè.

45 Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n’okpurum:

Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti.

46 Ndi ala ọzọ nāta aru,

Ke onwe-ha ihe-ọkiké, si n’ebe-nmechibido-ha puta.

47 Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;

Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu:

48 Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,

Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n’okpurum,

49 Onye nēme kwa ka m’si n’aka ndi-irom pua:

I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:

I nānaputam n’aka madu nēme ihe ike.

50 N’ihi nka ka m’gēkele Gi, Jehova, n’etiti mba ọzọ,

Aha-Gi ka m’gābùku kwa abù ọma.

51 Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku:

Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere,

Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 23

1 Ma ndi a bu okwu ikpe-azu nke Devid.

Ihe nke si n’ọnu Devid nwa Jesi puta,

Na ihe nke si n’ọnu nwoke ahu puta, bú onye emere ka o bilie,

Bayere onye nke Chineke Jekob etere manu,

Na onye nwere olu di utọ n’ibù abù ọma Israel:

2 Mọ nke Jehova kwuru site n’ọnum,

Okwu-Ya di kwa n’irem.

3 Chineke Israel siri,

Mu ka Oké Nkume Israel gwara okwu:

Onye nāchi madu bu onye ezi omume,

Ọ nāchi n’egwu Chineke

4 Ọ di kwa ka ìhè ututu, mb͕e anyanwu nāwa,

Bú ututu igwe-oji nādighi;

Mb͕e ahihia ndu nēpuputa n’ala,

Site n’ọmumu-anyanwu, site na miri-ozuzo.

5 N’ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n’ebe Chineke nọ;

N’ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem,

Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n’usoro n’ihe nile, nke edebewo-kwa-ra:

N’ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile,

N’ezie Ọ gaghi-eme ka o pute.

6 Ma ndi jọb͕uru onwe-ha di ka ogwu anēkopu ekopu, ha nile,

N’ihi na ọ bughi aka ka eji ewere ha:

7 Ma nwoke nke nēmetu ha aka

Gēnweju ígwè na osisi ube aka:

Agēwere kwa ọku suresia ha n’ọnọdu-ha.

8 Ndia bu aha ndi-dike, ndi Devid nwere; Josheb-bashebet onye-Tahkemonait, onye-isi nke ndi-ọchi-agha; onye ahu bu Adino onye-Eznait: onye nēmegide nnù ndikom abua eb͕uru n’otù ub͕ò.

9 Nke so ya bu Eleeza nwa Dodai nwa onye Ahoa, bú otù onye n’etiti ndi-dike atọ ahu ndi ha na Devid nọ mb͕e ha rara onwe-ha nye rue ọnwu n’etiti ndi Filistia ndi chikọtara onwe-ha n’ebe ahu ibu agha, ma ndikom Israel rigoro:

10 onye ahu biliri, tib͕u ndi Filistia rue mb͕e ike gwuru aka-ya, aka-ya we rapara na mma-agha: Jehova we zọputa nzọputa uku n’ubọchi ahu; ndi Israel we laghachi soro ya n’azu nání iyipu ihe di n’aru ndi eb͕uru eb͕u.

11 Nke so ya bu Shama nwa Agi onye-Hararait. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha n’usu, ma òkè ubi di n’ebe ahu juputara na lentil; ma ndi Israel b͕apuru n’iru ndi Filistia.

12 O we guzo onwe-ya n’etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia: Jehova we zọputa nzọputa uku.

13 Ndikom atọ n’etiti orú ndi-isi na iri ahu we rida, biakute Devid n’owuwe-ihe-ubi rue ọb͕à Adulam; ma usu ndi Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.

14 Ma Devid nọ n’ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.

15 Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m’ṅua miri sitere n’olùlù-miri Bet-lehem, nke di n’ọnu-uzọ-ama:

16 Ndi-dike atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n’olùlù-miri Bet-lehem, nke di n’ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma o kweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova.

17 Ọ si, Ya burum ihe-árú, Jehova, ime ihe a: #m’gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n’aka-ha nēje? o kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.

18 Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n’etiti ndikom atọ ahu.

19 Àdighi-asọpuru ya kari ndikom atọ ahu? o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu.

20 Benaia kwa, nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n’ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n’etiti olùlù n’ubọchi snow nēzò.

21 Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, bú nwoke mara nma ile anya: ube di kwa n’aka onye Ijipt ahu; ma o ji nkpa-n’aka ridakuru ya, napu ube ahu n’aka onye Ijipt n’ike, were ube-ya b͕ue ya.

22 Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n’etiti ndi-dike atọ ahu.

23 Anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Devid we do ya ibà n’etiti ndi nānu okwu-ya.

24 Asahel nwa-nne Joab bu otù onye n’etiti orú ndikom na iri ahu; Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;

25 Shama onye Harod, Elika onye Harod;

26 Hilez onye-Paltait, Ira nwa Ikesh onye Tekoa;

27 Abieza onye Anatot, Mebunai onye Husha;

28 Zalmon onye Ahoa, Maharai onye Netofa;

29 Hileb nwa Beana onye Netofa, Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin;

30 Benaia onye Piraton, Hidai nke miri-iyi Gaash;

31 Abi-albon onye Araba, Azmavet onye Bahurim;

32 Eliahba onye Shaalabin, nke umu Jashen, Jonatan;

33 Shama onye-Hararait, Ahiam nwa Shara onye-Ararait;

34 Elifelet nwa Ahasbai, nwa onye Meakat, Eliam nwa Ahitofel onye Gailo;

35 Hezro onye Kamel, Paarai onye Arab;

36 Igal nwa Netan nke Zoba, Bani onye Gad;

37 Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia;

38 Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta;

39 Uraia onye Het: ha nile di orú ndikom na iri na asa.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 24

1 Iwe Jehova we di kwa ọku ọzọ megide Israel, O we kpalie Devid imegide ha, si, Je guta Israel na Juda.

2 Eze we si Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, nke di n’aka-ya, Biko, jegharia n’ebo nile nke Israel, site na Dan we rue Bia-sheba, gukọtanu ndi Israel, ka m’we mara ọnu-ọgugu ndi Israel.

3 Joab we si eze, Ka Jehova, bú Chineke-gi, tukwasi-kwa-ra ndi Israel, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise, ka anya onye-nwem, bú eze, hu kwa ya: ma onye-nwem, bú eze, n’ìhi gini ka ihe a nātọ ya utọ?

4 Ma okwu eze di ike n’ebe Joab nọ, na n’aru ndi-isi usu-ndi-agha. Joab na ndi-isi usu-ndi-agha we si n’iru eze pua igukọta ndi ahu, bú Israel.

5 Ha we gabiga Jọdan, ma ulo-ikwū-ha n’Aroea, n’aka-nri obodo ahu nke di n’etiti ndagwurugwu Gad, we rue Jeza:

6 ha we biarue Gilead, ru kwa ala Tahtim-họdshi; ha we biarue Dan-jaan, je buruburu rue Zaidon,

7 biarue ebe ewusiri ike nke Taia, na obodo nile nke ndi-Haivait na ndi Kenean, purue Negeb Juda, nime Bia-sheba.

8 Ha we jegharia n’ala nile, biarue Jerusalem n’ọgwugwu ọnwa iteghete na orú ubọchi.

9 Joab we nye eze ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel: ma orú nnù ndikom ọgu uzọ ise di n’Israel, ndi bu dìnkpà ndi nāmiputa mma-agha; ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri.

10 Obi Devid we ta ya uta mb͕e ọ gusiri ndi Israel. Devid we si Jehova, Emehiewom nke-uku n’ihe m’meworo: ma ub͕u a, Jehova, biko me ka ajọ omume-orú-Gi gabiga; n’ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku.

11 Devid we bilie n’ututu, okwu Jehova we rue Gad nti, bú onye-amuma, onye-ọhu-uzọ nke Devid, si,

12 Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēbokwasi gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M’we me gi ya.

13 Gad we biakute Devid, si, ya, Ọ̀ bu oké unwu arọ asa gābiakute gi n’ala-gi? mà-ọbu na i ganāb͕alaga n’iru ndi nākpab͕u gi ọnwa atọ, mb͕e ndi ahu nāchu gi: mà-ọbu na ajọ ọria nēfe efe gādi n’ala-gi ubọchi atọ? ub͕u a mata, le kwa okwu m’gēweghachiri Onye nēzitem.

14 Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko, ka ayi dabà n’aka Jehova; n’ihi na obi-ebere-Ya bara uba: ma ka m’ghara idabà n’aka madu.

15 Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n’aru Israel site n’ututu we rue na mb͕e ákàrà: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we nwua n’etiti ndi Israel site na Dan we rue Bia-sheba.

16 Mọ-ozi we setipu aka-ya n’ebe Jerusalem di ibibi ya, Jehova we chègharia n’ihe ọjọ ahu we si mọ-ozi ahu nke nēbibi n’etiti ndi Israel, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nọ n’akuku ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.

17 Devid we gwa Jehova okwu, mb͕e ọ huru mọ-ozi ahu nke nētib͕u ndi Israel, ọ si, Le, mu onwem emehiewo, mu onwem emewo kwa ajọ omume: ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam.

18 Gad we biakute Devid n’ubochi ahu, si ya, Rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n’ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.

19 Devid we rigo dika okwu Gad si di, dika Jehova nyere n’iwu.

20 Arọna we le anya, hu eze na ndi-orù-ya ka ha nāgabigakute ya: Arọna we puta, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n’ala.

21 Arọna we si, Gini mere onye-nwem, bú eze, biakuteworo orù-ya? Devid we si, Izuru ebe-nzọcha-ọka-gi n’aka-gi, iwuru Jehova ebe-ichu-àjà, ka ewe b͕ochie ihe otiti a n’ebe ndi Israel nọ.

22 Arọna we si Devid, Ka onye-nwem, bú eze were ihe di nma n’anya-ya sure ọku, le, ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka nile na ihe ehi nile ka ha buru nkú:

23 ihe a nile onye-nwem eze ka Arọna, nyere eze. Arọna we si eze, Ka ihe-gi tọ Jehova, bú Chineke-gi, utọ

24 Eze we si Arọna, É-è; kama aghaghm izuru ya n’aka-gi n’ọnu-ahia: m’gaghi-esure-kwa-ra Jehova, bú Chinekem, àjà-nsure-ọku nke m’nētiyeghi ego ọ bula. Devid we were ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri zuru ebe-nzọcha-ọka ahu na ehi ahu.

25 Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n’ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo. Ewe riọta Jehova aririo bayere ala ahu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu n’ebe Israel nọ.