Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 11

1 O rue, n’ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Devid zigara Joab, ya na ndi-orù-ya, na Israel nile; ha we bibie umu Amon, nọchigide kwa Raba n’agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem.

2 O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n’ihe-ndina-ya bilie, jegharia n’elu ulo eze: o we si n’elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n’ile anya.

3 Devid we zìe jua ajuju bayere nwayi ahu. Otù onye we si, Nwayi a, ọ̀ bughi Bat-sheba, nwa-nwayi Eliam, bú nwunye Urai onye Het?

4 Devid we ziga ndi-ozi, kuru ya; nwayi ahu we biakute ya, ya na ya we dina; (ma nwayi ahu si n’ọrurú-ya nēdo onwe-ya nsọ,) o we laghachi n’ulo-ya.

5 Nwayi ahu we turu ime; o zìe, gosi Devid, si, Mu onwem di ime.

6 Devid we zigara Joab ozi, si, Ziterem Uraia onye Het. Joab we zigara Devid Uraia.

7 Uraia we biakute ya, Devid we jua ya ajuju bayere udo Joab, baye-kwa-ra udo ndi Israel, na otú agha nāga.

8 Devid we si Uraia, Rida n’ulo-gi, sa ukwu-gi. Uraia we si n’ulo eze pua, onyinye nri eze nyere ya we puso ya n’azu.

9 Ma Uraia dinara n’ọnu-uzọ ulo eze n’etiti ndi-orù nile nke onye-nwe-ya, ọ ridaghi kwa rue ulo-ya.

10 Ha we gosi Devid, si, Uraia aridaghi rue ulo-ya. Devid we si Uraia, Ọ̀ bughi n’ije ka gi onwe-gi si bia? gini mere i ridaghi rue ulo-gi?

11 Uraia we si Devid, Ib͕e Chineke, na Israel, na Juda, nānọdu n’ulo-ntu; onye-nwem Joab na ndi-orù onye-nwem nānọ kwa n’ulo-ikwū n’ọhia; ma mu onwem, m’gābà n’ulom, iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu, na isoro nwunyem dina? ndu-gi, na ndu nkpuru-obi-gi, ma ọ buru na emem ihe a.

12 Devid we si Uraia, Nọdu kwa n’ebe a ta, echi ka m’gezilaga kwa gi. Uraia we nọdu na Jerusalem ubọchi ahu na echi-ya.

13 Devid we kpọ ya, o we rie ihe n’iru ya, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; Devid we me ya ka ọ ṅubiga manya okè: o we pua n’anyasi idina n’ihe-ndina-ya n’etiti ndi-orù onye-nwe-ya, ma ọ ridaghi rue ulo-ya.

14 O rue, n’ututu, na Devid degara Joab akwukwọ, we ziga ya site n’aka Uraia.

15 O we de n’akwukwọ ahu, si, Donu Uraia na ncherita-iru agha ahu nke siri ike kari, sinu n’iso ya la azu, ka ewe tib͕ue ya, o we nwua.

16 O rue, mb͕e Joab nēche obodo nche, na o tiyere Uraia n’ebe ọ mara na ndikom bu dì-nkpà nọ.

17 Ndikom obodo we pua, buso Joab agha: ufọdu n’etiti ndi Israel we da, bú n’etiti ndi-orù Devid; Uraia onye Het nwu-kwa-ra.

18 Joab we ziga gosi Devid ihe nile emere n’agha ahu;

19 o we nye onye-ozi iwu, si, Mb͕e i gwabìri eze okwu agha nile,

20 o gēru kwa, ọ buru na ọnuma nke eze ebilie, o we si gi, Gini mere unu jeruru obodo ahu nso ibu agha? ùnu amaghi na ha gēsi na mb͕idi b͕a uta?

21 ònye tib͕uru Abimelek nwa Jerubeshet? nwàyi esighi na mb͕idi tua aka-nkume n’isi-ya, o we nwua na Tibez? n’ìhi gini ka unu jeruru mb͕idi nso? i gāsi kwa, Orù-gi bú Uraia onye Het, anwuwo kwa.

22 Onye-ozi ahu we je, bata, gosi Devid ihe nile Joab ji zìe ya.

23 Onye-ozi ahu we si Devid, Ndikom ahu di ike imegide ayi, we pukute ayi rue ọhia, ayi we bugide ha agha rue oghere ọnu-uzọ-ama.

24 Ndi-ọb͕a-uta we si na mb͕idi nāb͕a ndi-orù-gi uta; ufọdu n’etiti ndi-orù eze we nwua, orù-gi, bú Uraia onye Het, anwuwo kwa.

25 Devid we si onye-ozi ahu, Otú a ka i gāsi Joab, Ka ihe a ghara ijọ njọ n’anya-gi, n’ihi na mma-agha nēripia otù onye dika ọ nēripa onye ọzọ: me ka agha-gi di ike megide obodo ahu, kwadà ya: gi me kwa ka ọ di ike.

26 Nwunye Uraia we nu na Uraia, bú di-ya, anwuwo, o we tiere di-ya aka n’obi.

27 Iru-újú ahu we gabiga, Devid we ziga, webata ya n’ulo-ya, o we ghọrọ ya nwunye, muara ya nwa. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ n’anya Jehova.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 12

1 Jehova we zìe Netan jekuru Devid. O we biakute ya, si ya, Ndikom abua di n’otù obodo; otù bu ọgaranya, nke-ọzọ bu ob͕eye.

2 Ọgaranya ahu nwere ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi bara uba nke-uku.

3 Ma ob͕eye ahu enweghi ihe ọ bula, ma-ọbughi otù nwa-nne-aturu ntà, nke ọ zutara debe ya ndu: o we nọyere ya, nọye-kwa-ra umu-ya, tolite; n’iberibe ihe-oriri-ya ka ọ nēri, n’iko-ya ka ọ nāṅu kwa, n’obi-ya ka o nēdina kwa, o we ghọrọ ya nwa-nwayi.

4 Onye-ije we biakute ọgaranya ahu, o we rapu iwere anu n’etiti ìgwè ewu na aturu-ya ma-ọbu n’etiti ìgwè ehi-ya, idoziri onye-ije ahu nke biakutere ya, ma o were nwa-nne-aturu nke ob͕eye, doziere nwoke ahu biakutere ya.

5 Iwe Devid we di ọku nke-uku megide nwoke ahu; o we si Netan, Jehova nādi ndu, n’ezie onye kwesiri ọnwu ka nwoke ahu bu nke nēme ihe a:

6 ma nwa-nne-aturu ahu, ọ gākwughachi kwa ya ob͕eye ahu okpukpu anọ, n’ihi na o mere ihe a, na n’ihi na o nweghi ọmiko.

7 Netan we si Devid, Gi onwe-gi ka nwoke ahu bu. Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem tere gi manu ibu eze Israel, Mu onwem naputa-kwa-ra gi n’aka Sọl;

8 M’we nye gi ulo onye-nwe-gi, na ndinyom onye-nwe-gi n’obi-gi, nye kwa gi ulo Israel na nke Juda; ma ọ buru na nke ahu di ntà, M’gātukwasi-kwa-ra gi otú a na otú a.

9 Gini mere i ji lelì okwu Jehova, ime ihe jọrọ njọ n’anya-Ya? i werewo mma-agha tib͕ue Uraia onye Het, nwunye-ya ka i werewo-kwa-ra n’onwe-gi na nwunye; ma ya onwe-ya, i werewo mma-agha umu Amon b͕ue ya.

10 Ma ub͕u a mma-agha agaghi-ewezuga onwe-ya n’ulo-gi rue mb͕e ebighi-ebi; n’ihi na i lelìwom, we kuru nwunye Uraia onye-Het ka ọ ghọrọ gi nwunye.

11 Otú a ka Jehova siri, Le, M’nēme ka ihe ọjọ si n’ulo-gi bilie imegide i, M’gāchiri kwa ndinyom-i n’anya-gi nye ibe-gi, ọ gēso kwa ndinyom-i dina n’anya anyanwu a.

12 N’ihi na gi onwe-gi mere ya na nzuzo: ma Mu, onwem gēme ihe a n’iru Israel nile, na n’iru anyanwu.

13 Devid we si Netan, Emehiewom megide Jehova. Netan we si Devid, Jehova emewo kwa ka nmehie-gi gabiga; i gaghi-anwu.

14 Otú ọ di, n’ihi na i mewo ka ndi-iro Jehova kpọlu nkpọlu nke-uku n’okwu a, nwa-nwoke nke amuru gi aghaghi inwu kwa.

15 Netan we la n’ulo-ya.

Jehova we tie nwata ahu ihe-otiti, bú nke nwunye Uraia muru nye Devid, o we nāria ọria nke-uku.

16 Devid we riosie Chineke aririọ ike bayere nwata ahu; Devid we nēbu ọnu, ba nime, dina ala ogologo abali nile.

17 Ndi-okenye ulo-ya we bilie n’akuku ya, ime ka o si n’ala bilie: ma o kweghi, o soghi kwa ha ri nri.

18 O rue, n’ubọchi nke-asa, na nwa ahu nwuru. Ndi-orù Devid we tua egwu igosi ya na nwa ahu anwuwo: n’ihi na ha siri, Le, mb͕e nwa ahu nọ na ndu, ayi gwara ya okwu, ma o geghi nti n’olu-ayi: àyi gēsi kwa aṅa si ya, Nwa ahu anwuwo, o we me onwe-ya ihe ọjọ?

19 Devid we hu na ndi-orù-ya nātakwurita onwe-ha, Devid we mata na nwa ahu anwuwo: Devid we si ndi-orù-ya, Nwa ahu, ọ̀ nwuwo? Ha si, Ọ nwuwo.

20 Devid we si n’ala bilie, sa aru, te onwe-ya manu, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya; o we ba n’ulo Jehova, kpọ isi ala: o we ba n’ulo-ya, jua ha, ha we d-oba nri n’iru ya, o rie.

21 Ndi-orù-ya we si ya, Gini bu ihe a nke i meworo? ọ bu n’ihi nwa ahu, mb͕e ọ nọ na ndu, ka i būru ọnu, kwa ákwá; ma mb͕e nwa ahu nwuru, i biliri rie nri.

22 Ọ si, Mb͕e nwa ahu nọ na ndu, eburum ọnu, kwa ákwá’ n’ihi na m’siri, Ònye mara? eleghi anya Jehova gēmerem amara, ka nwa ahu we di ndu.

23 Ma ub͕u a ọ nwuwo, n’ìhi gini kwa ka mu onwem gēbu ọnu? àpurum iweghachi ya ọzọ? Mu onwem nālakuru ya, ma ya onwe-ya agaghi-alaghachikutem.

24 Devid we kasie Bat-sheba, bú nwunye-ya, obi, we bakuru ya, ya na ya we dina: o we mua nwa-nwoke, Devid we kpọ aha-ya Solomon. Jehova we hu ya n’anya;

25 O we zìe site n’aka Netan, bú onye-amuma, kpọ aha-ya Jedidaia, n’ihi Jehova.

26 Ma Joab busoro Raba nke umu Amon agha, were obodo eze.

27 Joab we zigara Devid ndi-ozi, si, Ebusowom Raba agha, ewerewokwam obodo miri.

28 Ma ub͕u a, chikọta ndi Israel fọduru, ma kwa ulo-ikwū-gi megide obodo ahu, were ya; ka mu onwem ghara iwere obodo ahu, ewe kpọkwasi ya aham.

29 Devid we chikọta ndi Israel nile, jerue Raba, buso ya agha, were ya.

30 O we kpupu okpu-eze nke eze-ha n’isi-ya; ọtùtù-ya bu otù talent ọla-edo, nkume di oké ọnu-ahia di kwa ya; o we di n’isi Devid. O weputa-kwa-ra ihe-nkwata obodo ahu, nke riri nne nke-uku.

31 O me-kwa-ra ka ndi nọ nime ya puta, o tiye ha n’okpuru mma-nkwọ, na n’okpuru ígwè nēbì ihe, na n’okpuru anyu-ike ígwè, me kwa ka ha gabiga n’ihe eji akpu brick: otú a ka ọ nēme kwa obodo nile nke umu Amon. Devid na ndi Israel nile we lata na Jerusalem.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 13

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom nwa Devid nwere nwa-nne-nwayi mara nma, aha-ya bu Tema; Amnon nwa Devid we hu ya n’anya.

2 O we di Amnon nkpà otú a, na o mere onwe-ya onye aru nādighi ike n’ihi Tema, bú nwa-nne-ya; n’ihi na nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke ka ọ bu; o we di ike n’anya Amnon ime ya ihe ọ bula.

3 Ma Amnon nwere otù eyì, aha-ya bu Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid: ma Jonadab bu nwoke mara ihe nke-uku.

4 O we si ya, Gini mere gi onwe-gi nāta aru otú a kwa-ututu, gi nwa eze? ì gaghi-egosim? Amnon we si ya, Tema, bú nwa-nne-nwayi Absalom nwa-nnem, ka mu onwem nāhu n’anya.

5 Jonadab we si ya, Dinakwasi n’ihe-ndina-gi, me onwe-gi onye aru nādighi ike: ma mb͕e nna-gi batara ihu gi, i gāsi ya, Biko, ka Tema, bú nwa-nnem, bata, ka o me kwa ka m’rie nri, ka o dozi kwa ihe-oriri ahu n’anyam, ka m’we hu ya, rie ya n’aka-ya.

6 Amnon we dina, mee onwe-ya onye aru nādighi ike: eze we bata ihu-ya, Amnon we si eze, Biko, ka Tema, bú nwa-nnem, bata, me achicha abua n’anyam, ka m’we rie ha n’aka-ya

7 Devid we zigara Tema ozi n’ulo, si, Biko, je n’ulo Amnon nwa-nne-gi, doziere ya ihe-oriri.

8 Tema we je n’ulo Amnon nwa-nne-ya; ma onye ahu nēdina edina. O we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, gwọ ya, me achicha n’anya-ya, sie achicha ahu.

9 O were ite, wupu ha n’iru ya; ma ọ juru iri ha. Amnon we si, Me ka madu ọ bula si n’ebe m’nọ pua. Ha we pua, madu ọ bula, n’ebe ọ nọ.

10 Amnon we si Tema, Bubata ihe-oriri n’ime-ulo, ka m’we rie ya n’aka-gi. Tema we chiri achicha nke o mere, chitara Amnon nwa-nne-ya n’ime-ulo.

11 Ọ chita ha nso ya ka o rie, Amnon we jide ya, si ya, Bia, sorom dina, nwa-nnem.

12 Ọ si ya, É-è nwa-nnem, ewedalam n’ala; n’ihi na adighi-eme otú a n’Israel: emela ihe-nzuzu a.

13 Ma mu onwem, òle ebe m’gēme ka ita-utam la? ma gi onwe-gi, i gādi ka otù onye nime ndi-nzuzu n’israel. Ma ub͕u a, biko, gwa eze okwu; n’ihi na ọ gaghi-eb͕ochim n’ebe i nọ.

14 Ma ọ kweghi ige nti olu-ya: ọ di kwa ike kari ya, ọ we weda ya n’ala, soro ya dina.

15 Amnon we kpọ ya asì, bú ikpọ-asì di uku ri nne; n’ihi na ikpọ-asì ọ kpọrọ ya di uku kari ihu-n’anya ọ huru. Amnon we si ya, Bilie, la.

16 Ọ si ya, Emela otú a, n’ihi na ihe ọjọ uku a n’izilagam jọrọ njọ kari nke-ọzọ nke i merem. Ma o kweghi ige ya nti.

17 O we kpọ nwa-okorọbia-ya nke nejere ya ozi, si, Biko, si n’ebe m’nọ chupu nwayi a n’èzí, kpachie uzọ n’azu ya.

18 Ma uwe-nwudaa nwere aka di n’aru ya: n’ihi na uwe-nwuda di otú a ka umu-ndinyom eze ndi nāmaghi nwoke nēyi. Onye nējere ya ozi we me ka ọ pua n’èzí, we kpachie uzọ n’azu ya.

19 Tema we būru ntu n’isi-ya dọwa uwe-nwuda nwere aka nke di n’aru ya; ọ tukwasi aka-ya n’isi-ya, we la, nēje nēti nkpu.

20 Absalom, bú nwa-nne-ya, we si ya, Amnon nwa-nne-gi, ò sorowo gi dina? ma ub͕u a, nwa-nnem, b͕a nkiti: nwa-nne-gi ka ọ bu; atukwasila obi-gi n’ihe a. Tema we nọdu dika nwayi arapuru nání ya, n’ulo Absalom nwa-nne-ya.

21 Ma eze, bú Devid, nuru ihe ndia nile, iwe-ya we di ọku nke-uku.

22 Ma Absalom agwaghi Amnon okwu ọ bula ma ọ bu nke di njọ ma-ọbu nke di nma: n’ihi na Absalom kpọrọ Amnon asì. n’ihi na ọ wedara Tema nwa-nne-ya n’ala.

23 O rue, mb͕e arọ abua zuru ezu gasiri, na Absalom nwere ndi nākpacha aji anu na Beal-hezoa, nke di n’akuku Efraim: Absalom we kpọ umu-ndikom eze nile.

24 Absalom we biakute eze, si, Biko, le, Orù-gi nwere ndi nākpacha aji anu; biko, ka eze na ndi-orù-ya soro orù gi je.

25 Eze we si Absalom, É-è, nwam, biko, emela ka ayi nile je, ka ayi we ghara ibu edi arọ́ n’isi gi. O rugid ya: ma o kweghi ije, ma ọ gọziri ya.

26 Absalom we si, Ma ọ buru na i jeghi, biko, ka Amnon nwa-nnem soro ayi je. Eze we si ya, Nìhi gini ka ọ gēsoro gi je?

27 Absalom we rugide ya, o we zie Amnon na umu-ndikom eze nile ka ha soro ya je.

28 Absalom we nye ndi-orù-ya iwu, si, Biko, lezienu anya. mb͕e obi Amnon di nma na manya-vine; mb͕e m’si kwa unu, Tibuenu Amnon, menu ka ọ nwua, unu atula egwu: ọ̀ bughi na mu onwem enyewo unu iwu? dinu ike, buru-kwa-nu ndi-dìnkpà.

29 Umu-okorọbia Absalom we me Amnon dika Absalom nyere iwu. Umu-ndikom eze nile we bilie, rikwasi, nwoke ọ bula n’elu inyinya mule-ya, ha we b͕alaga.

30 O rue, mb͕e ndi ahu nọ n’uzọ, na akukọ ahu biaruru Devid nti, si, Absalom eb͕uwo umu-ndikom eze nile, ọ dighi kwa otù onye fọduru nime ha.

31 Eze we bilie, dọwa uwe-ya nile, dina n’ala; ndi-oru-ya nile nēguzo kwa, ha na uwe-ha dọwara adọwa.

32 Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid, we za, si, Ka onye-nwem ghara isi na emewo ka umu-okorọbia nile, bú umu eze, nwua; n’ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu: n’ihi na edoro nka n’okwu-ọnu Absalom site n’ubọchi o wedara Tema nwa-nne-ya n’ala.

33 Ma ub͕u a ka onye-nwem, bú eze, ghara ido okwu a n’obi-ya, si, Umu-ndikom eze nile anwuwo, n’ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu.

34 Absalom we b͕alaga. Nwa-okorọbia nke nēche nche we welie anya-ya hu, ma, le, ndi riri nne nābia site n’uzọ akuku ugwu di n’azu ya.

35 Jonadab we si eze, Le, umu-ndikom eze abiawo: dika okwu orù-gi kwuru, otú a ka ọ di.

36 O rue na, mb͕e o kwubìri okwu, le, umu-ndikom eze biara, welie olu-ha, kwa ákwá: ọzọ kwa eze na ndi-orù-ya nile kwara ákwá di uku ri nne.

37 Ma Absalom b͕alagara jekuru Talmai nwa Amihua, eze Geshua. Devid we nēru újú nwa-ya ubọchi nile.

38 Absalom we b͕alaga, jerue Geshua, nọ n’ebe ahu arọ atọ.

39 Agu nāgusi nkpuru-obi Devid, bú eze, ike ipukuru Absalom: n’ihi na akasiri ya obi bayere Amnon, n’ihi na ọ nwuwo.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 14

1 Joab nwa Zeruaia we mara na obi eze di n’ebe Absolom nọ.

2 Joab we ziga ozi na Tekoa, si n’ebe ahu kuta otù nwayi mara ihe, si ya, Biko, me onwe-gi onye nēru újú biko, yiri kwa uwe iru-újú, ete-kwa-la onwe-gi manu, kama di ka nwayi nke nēru újú ọtutu ubọchi ndia n’ihi onye nwuru anwu:

3 i gābakuru kwa eze, gwa ya okwu dika okwu a si di. Joab we tiye okwu n’ọnu-ya.

4 Nwayi Tekoa we gwa eze okwu, da kpue iru-ya n’ala, kpọ isi ala, si, Zọputam eze.

5 Eze we si ya, Gini nēme gi? Ọ si, n’ezie nwayi di-ya nwuru ka m’bu, dim anwuwo kwa.

6 Nwayi nējere gi ozi nwe-kwa-ra umu-ndikom abua, ha abua we lua ọ̀gù n’ọhia, ọ dighi kwa onye-nnaputa n’etiti ha, ma otù onye tib͕uru ibe-ya, me ka ọ nwua.

7 Ma, le, ab͕uru-ha nile ebiliwo megide nwayi nējere gi ozi, ha we si, Nye ayi onye tib͕uru nwa-nne-ya, ka ayi we me ka ọ nwua n’ọnodu ndu nwa-nne-ya onye o b͕uru, ayi gēkpochapu kwa onye-nnweta ahu: ma ha gēmenyu icheku nkem nke fọduru, we ghara idoro dim aha ma-ọbu ndi fọduru n’elu uwa.

8 Eze we si nwayi ahu, La n’ulo-gi, mu onwem gēnye kwa iwu bayere gi.

9 Nwayi Tekoa ahu we si eze, N’isim, onye-nwem, eze, ka ajọ omume a di, na n’isi ulo nnam: ma ka eze na oche-eze-ya buru ndi ikpe nāmaghi.

10 Eze we si, Onye nāgwa gi okwu, me ka ọ biakutem, ọ gaghi-emetu kwa gi aka ọzọ.

11 Nwayi ahu we si, Biko, ka eze cheta Jehova, bú Chineke-gi, ka onye-ọ́bọ̀ ọbara ghara ibibi nke-uku, ka ha we ghara ikpochapu nwam nwoke. Devid we si, Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nwa-gi gāda n’ala.

12 Nwayi ahu we si, Biko, ka nwayi nējere gi ozi gwa onye-nwem, bú eze, okwu. Ọ si, kwue.

13 Nwayi ahu we si, Ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka i chère ihe di otú a megide ndi Chineke? n’ihi na eze nēkwu okwu a dika onye ikpe mara, ebe eze nādighi-eme ka onye nke ya achupuru achupu lata.

14 N’ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n’ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n’ebe Ọ nọ.

15 Ma ub͕u a, ebe m’biaworo igwa eze, bú onye nwem, okwu a, ọ bu n’ihi na ndim emewo ka m’tua egwu; nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka m’gwa eze okwu; eleghi anya eze gēme okwu nke orù-ya nwayi.

16 N’ihi na eze gānu, inaputa orù-ya nwayi n’ọbu-aka nwoke nāchọ ikpochapu mu na nwam nwoke n’otù n’ihe-nketa Chineke.

17 Nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka okwu onye-nwem, bú eze, diri izu-ike: n’ihi na dika mọ-ozi nke Chineke, otú a ka onye-nwem, bú eze, di inu ezi ihe na ihe ọjọ: Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi.

18 Eze we za, si nwayi ahu, Biko, ezonarilam okwu nke mu onwem nāju gi. Nwayi ahu we si, Biko, ka onye-nwem, bú eze, kwue.

19 Eze we si, Àka Joab diyere gi n’ihe a nile? Nwayi ahu we za, si, Ndu nke nkpuru-obi-gi, onye-nwem, bú eze, ọ dighi onye ọ bula nēsi n’ihe ọ bula onye nwem, bú eze, kwuru, che iru n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe: n’ihi na orù-gi, bú Joab, ya onwe-ya nyerem iwu, ya onwe-ya tiye-kwa-ra okwu ndia nile n’ọnu nwayi nējere gi ozi:

20 ọ bu ichighari iru okwu a ka Joab, bú orù-gi meworo ihe a: ma onye-nwem bu onye mara ihe, dika amam-ihe nke mọ-ozi nke Chineke, ima ihe nile di n’uwa.

21 Eze we si Joab, Biko, le emewom ihe a: gi je kwa, me ka nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, lata.

22 Joab we da kpue iru-ya n’ala, kpọ isi ala, gọzie eze: Joab we si, Ta ka orù-gi mara na ahutawom amara n’iru-gi, onye-nwem, bú eze, ebe eze meworo okwu orù-ya.

23 Joab we bilie je Geshua, me ka Absalom bia ba na Jerusalem.

24 Eze we si, Ka o chigharia la n’ulo-ya, ma ọ gaghi-ahu irum anya. Absalom we chigharia la n’ulo-ya, ma ọ hughi iru eze.

25 Ma n’Israel nile ọ dighi nwoke mara nma dika Absalom anētò nke-uku: site n’ọbu-ukwu-ya we rue opu-n’isi-ya ọlu adighi n’aru-ya.

26 Ma mb͕e ọ kọpuru isi-ya, (n’ihi na ọ bu n’ogwugwu arọ n’ọgwugwu arọ ka ọ nākọpu ya: n’ihi na agiri-isi di arọ́ n’isi-ya, o we kọpu ya:) o we tua agiri-isi di n’isi-ya ọgu shekel iri, n’ihe-ọtùtù eze.

27 Ewe muara Absalom umu-ndikom atọ, na otù nwa-nwayi, aha-ya bu Tema: onye ahu bu nwayi mara nma ile anya.

28 Absalom we biri na Jerusalem arọ abua zuru ezu; ma ọ hughi iru eze.

29 Absalom we zigara Joab ozi, iziga ya jekuru eze; ma o kweghi ibiakute ya: O we ziga ọzọ nke ub͕ò abua, ma ọ kweghi ibia.

30 O we si ndi-orù-ya, Lenu, òkè ala-ubi Joab di n’akuku alam, o nwe-kwa-ra ọka barley n’ebe ahu: jenu, sue ya ọku. Ndi-orù Absalom we sue òkè ala-ubi ahu ọku.

31 Joab we bilie, biakute Absalom rue ulo-ya, si ya, N’ìhi gini ka ndi-orù-gi suworo òkè ala-ubim ọku?

32 Absalom we si Joab, Le, eziterem i ozi, si, Bia n’ebe a, ka m’ziga kwa gi jekuru eze, si N’ìhi gini ka m’siworo na Geshua bia? ọ gādim nma ma asi na mu onwem anọdu n’ebe ahu rue ub͕u a: ma ub͕u a ka m’hu iru eze; ọ buru kwa na ajọ omume adi nimem, ya me ka m’nwua.

33 Joab we biakute eze, gosi ya: o we kpọ Absalom, o we biakute eze, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ya n’ala n’iru eze: eze we sutu Absalom ọnu.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 15

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom doziri onwe-ya ub͕ọ-ala na inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n’iru ya.

2 Absalom we bilie n’isi-ututu, guzo n’akuku uzọ ọnu-uzọ-ama: o rue, mb͕e nwoke ọ bula nwere okwu nke gēru eze nti ka o we kpe ya, na Absalon kpọro ya, si, Òle obodo gi onwe-gi si bia? Ọ si, Otú nime ebo Israel ka orù-gi si bia.

3 Absalom we si ya, Le, okwu-gi nile di nma, zi kwa ezi; ma ọ dighi onye nēge gi nti site n’ebe eze nọ.

4 Absalom we si, Ònye gēdom onye-ikpe n’ala nka, ka nwoke ọ bula nke nwere okwu ma-ọbu ikpé we biakutem, m’we kpọ ya onye ezi omume!

5 O rue, mb͕e nwoke ọ bula biaruru ya nso ikpọ isi ala nye ya, na o setiri aka-ya, jide ya, sututu ya ọnu.

6 Absalom we mere Israel nile dika okwu a si di, bú ndi biakutere eze ka ekpe ha ikpe: Absalom we zuru obi ndikom Israel n’ori.

7 O rue, n’ọgwugwu ọgu arọ abua, na Absalom siri eze, Biko, ka m’je kwughachi nkwam, nke, m’kwere Jehova, nime Hebron.

8 N’ihi na orù-gi kwere nkwa mb͕e m’biri na Geshua nime Siria, si, Ọ buru na Jehova eme ka m’laghachi na Jerusalem n’ezie, m’gēfè kwa Jehova òfùfè.

9 Eze we si ya, Je n’udo. O we bilie, jerue Hebron.

10 Absalom we ziga ndi-nledo n’ebo nile nke Israel, si, Mb͕e unu nuru olu opì-ike, unu gāsi kwa, Absalom bu eze na Hebron.

11 Ọgu ndikom iri we si na Jerusalem soro Absalom je, bú ndi akpọrọ, ha we nēje n’izu-okè obi-ha; ma ha amaghi ihe ọ bula.

12 Absalom we zipu Ahitofel onye Gailo, bú onye nādu Devid ọdu, n’obodo-ya, bú Gailo mb͕e ọ nāchu àjà. Nkekọta ahu we di ike; ndi Israel nāba kwa uba nēje n’iru n’iru n’aka Absalom.

13 Onye nēgosi ihe we biakute Devid, si, Obi ndikom Israel di iso Absalom n’azu.

14 Devid we si ndi-orù-ya nile, ndi ya na ha nọ na Jerusalem, Bilienu, ka ayi b͕apu; n’ihi na ayi enweghi nb͕apu n’iru Absalom: menu ngwa ije, ka o we ghara ime ngwa rue ayi aru, me ka ihe ọjọ kwagide ayi, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo a.

15 Ndi-orù eze we si eze, Dika ihe nile si di nke onye-nwem, bú eze, garọputa, le, ndi-orù-gi.

16 Eze we pua, ya na ulo-ya nile ndi soro ya n’ukwu n’ukwu. Eze we rapu ndinyom iri, bú ndi-iko-ya nwayi, iche ulo.

17 Eze we pua, ya na ndi-ya nile ndi soro ya n’ukwu n’ukwu; ha we nọdu na Bet-meahak.

18 Ndi-orù-ya nile we nāgabiga n’akuku ya; ndi Keret nile, na ndi Pelet nile, na ndi Gat nile, bú nnù ndikom na ọgu iri ndi siri na Gat bia, soro ya n’ukwu n’ukwu, nāgabiga kwa n’iru eze.

19 Eze we si Itai, bú onye Gat, N’ìhi gini ka gi onwe-gi nēso kwa ayi je? laghachi, soro eze nọdu: n’ihi na onye ala ọzọ ka i bu, onye rapuru ala-ya ka i bu kwa; laghachi n’ebe-gi.

20 nyahuru bu ọbibia-gi, ọ̀ bu ta ka m’gēme gi ka i ṅagharia n’iso ayi je, n’ihi na mu onwem nēje ebe mu onwem nēje? gi laghachi, me kwa ka umu-nne-gi laghachi; ka ebere na ezi-okwu diyere gi.

21 Itai we za eze, si, Jehova nādi ndu, onye-nwem, bú eze, nādi kwa ndu, n’ezie n’ọnọdu ebe onye-nwem, bú eze, gānọ, ma-ọbu inwu ọnwu ma-ọbu idi ndu, n’ezie n’ebe ahu ka orù-gi gānọ kwa.

22 Devid we si Itai, Je gabiga. Itai onye Gat we gabiga, ya na ndikom-ya nile, na umu-ntakiri nile nke di n’aka-ya.

23 Ala ahu nile nākwa ákwá n’oké olu, ndi ahu nile nāgabiga kwa: eze nāgabiga kwa miri-iyi Kidron, ndi-ya nile nāgabiga kwa, n’iru uzọ ọzara.

24 Ma, le, Zedok bia-kwa-ra, ya na ndi Livai nile, nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke; ha we dọba ib͕e Chineke, Abaiata we rigo, rue mb͕e ndi ahu nile siri n’obodo gabigasia.

25 Eze we si Zedok Bughachi ib͕e Chineke n’obodo; o buru na ahutam amara n’iru Jehova, Ọ gēweghachim, me ka m’hu ya na ebe-obibi-Ya:

26 ma ọ buru na Ọ si otú a, Ihe-gi atọghm utọ; lem, Ya mem otú ọ di nma n’anya-Ya.

27 Eze we si Zedok, bú onye-nchu-àjà, Ọ̀ bughi onye-ọhu-uzọ ka i bu? laghachi n’obodo n’udo, unu na Ahimaaz nwa-gi, na Jonatan nwa Abaiata, bú umu-unu abua.

28 Lenu, mu onwem ganānọgide na ngabiga-miri nke ọzara, rue mb͕e okwu gēsi n’ebe unu nọ bia igosim ka ihe si di.

29 Zedok na Abaiata we bughachi ib͕e Chineke na Jerusalem: ha we nọdu n’ebe ahu.

30 Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá.

31 Otú onye we gosi Devid, si, Ahitofel di n’etiti ndi-nkekọta ahu ndi nēso Absalom. Devid we si, Biko, Jehova, me ka idu-ọdu Ahitofel ghọ ihe-nzuzu.

32 O rue, na mb͕e Devid biaruru elu nrigo ahu, ebe ọ nākpọ isi ala nye Jehova, le, Hushai, bú onye-Akait, biara izute ya, ya na uwe-ya adọwara adọwa, na ájá n’elu isi-ya.

33 Devid we si ya, Ọ buru na i sorom gabiga, i gābu-kwa-ram ibu:

34 ma ọ buru na i laghachi n’obodo, we si Absalom, Orù-gi ka m’bu, eze; dika mu onwem bu orù nna-gi na mb͕e gara aga, ub͕u a mu onwem gābu kwa orù-gi: i gēmebi-kwa-ram idu-ọdu Ahitofel.

35 Gi na ha anọghi kwa n’ebe ahu, bú Zedok na Abaiata ndi-nchu-àjà? o gēru kwa, na okwu ọ bula i gānu site n’ulo eze, i gēgosi ya Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà.

36 Le, ha na umu-ha ndikom abua nọ n’ebe ahu, bú Ahimaaz nwa Zedok, na Jonatan nwa Abaiata; site n’aka-ha ka unu gēzite-kwa-ram okwu ọ bula unu gānu.

37 Hushai, bú eyi Devid, we ba n’obodo; Absalom ba-kwa-ra nime Jerusalem.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 16

1 Devid we gabiga elu nrigo nke-ntà, ma, le, Ziba, onye nējere Mefiboshet ozi, zutere ya, chiri inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa, ọgu ob͕e achicha iri di kwa n’elu ha, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu nkpuru mb͕e okpom-ọku ise, na otù karama-akpukpọ manya-vine.

2 Eze we si Ziba, Gina ka i gēji ihe ndia me? Ziba we si, Inyinya-ibu ndia bu ka ndi ulo eze we nọkwasi ha; achicha na nkpuru mb͕e okpom-ọku bu ka umu-okorọbia we rie ha; manya-vine bu ka ndi nāda mbà nọzara we ṅua.

3 Eze we si, Ma òle ebe nwa onye-nwe-gi nọ? Ziba we si eze, Le, ọ nānọ na Jerusalem: n’ihi na ọ siri, Ta ka ulo Israel gēnyeghachim ala-eze nnam.

4 Eze we si Ziba, Le, gi gēnwe ihe nile Mefiboshet nwere. Ziba we si, Anamakpọ isi ala; ka m’huta amara n’iru gi, onye-nwem, bú eze.

5 Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n’ab͕uru ulo Sọl nēsi n’ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa.

6 Ọ tua Devid nkume, tu kwa ndi-orù nile nke eze, bú Devid: ndi Israel nile na ndi-dike nile di kwa n’aka-nri-ya na n’aka-ekpe-ya.

7 Ma otú a ka Shimai siri mb͕e ọ nākọcha, Pua, pua, gi nwoke ọbara na nwoke jọb͕uru onwe-ya:

8 Jehova eweghachiwo n’isi-gi ọbara nile nke ulo Sọl, onye i buworo eze n’ọnọdu ya; Jehova enyewo kwa ala-eze n’aka Absalom, bú nwa-gi: ma, le, n’ihe ọjọ gi ka ejideworo gi, n’ihi na nwoke ọbara ka i bu.

9 Abishai nwa Zeruaia we si eze, N’ìhi gini ka nkita nka nke nwuru anwu nākọcha onye-nwem, bú eze? biko, ka m’gabiga, wezuga isi-ya.

10 Eze we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ umu Zeruaia? mb͕e ọ nākọcha, mb͕e Jehova siwo-kwa-ra ya, Kọcha Devid; ònye gāsi kwa, Gini mere i meworo otú a?

11 Devid we si Abishai, si kwa ndi-orù-ya nile, Le nwam, nke siri n’afọm puta, nāchọ ndum: onye Benjamin nka, ò gēsi kwa aṅa ghara ichọkari ya ub͕u a? ka ọ nọduru onwe-ya, ka ọ kọcha kwa; n’ihi na Jehova siworo ya, Kọcha.

12 Eleghi anya Jehova gēlekwasi nwedam anya, Jehova gēnyeghachikwam ezi ihe n’ọnọnọdu nkọcha-ya ta.

13 Devid na ndikom-ya we je n’uzọ ahu: Shimai nēje kwa n’akuku ugwu na ncherita-iru ya, ọ nēje ije we kọcha, tu kwa nkume na ncherita-iru ya, kpoli kwa ájá.

14 Eze na ndi nile ndi ya na ha yikọrọ je, we biarue Ayefim; o we turu ndu n’ebe ahu.

15 Absalom na ndi nile, bú ndikom Israel, we ba na Jerusalem, Ahitofel so-kwa-ra ya ba.

16 O rue, mb͕e Hushai, bú onye-Akait, bú eyì Devid, biakutere Absalom, na Hushai siri Absalom, Ka eze di ndu, ka eze di ndu.

17 Absalom we si Hushai, Ọ̀ bu nka bu ebere i nēmere eyi-gi? n’ìhi gini ka i nēsoghi eyì-gi je?

18 Hushai we si Absalom, É-è, kama onye Jehova na ndi nka na ndikom nile nke Israel rọputaworo, ya ka m’gādiri, ọ bu kwa n’aka-ya ka m’gēbiri.

19 Ọzọ kwa, ònye ka mu onwem gēfè òfùfè? Ọ̀ bughi n’iru nwa-ya? dika m’fèworo òfùfè n’iru nna-gi, otú a ka m’gābu n’iru gi.

20 Absalom we si Ahitofel, Duanu ọdu n’onwe-unu ihe ayi gēme.

21 Ahitofel we si Absalom, Bakuru ndi-iko nna-gi ndinyom, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo; Israel nile gānu kwa na i nēsi nna-gi ísì ọjọ: aka ndi nile gi na ha nọ gādi kwa ike.

22 Ha we b͕asara Absalom ulo-ikwū n’elu ulo; Absalom we bakuru ndi-iko nna-ya ndinyom n’anya Israel nile.

23 Ọdu Ahitofel, nke ọ duru na mb͕e ahu, di ka agāsi na ajuru ase n’okwu Chineke: otú a ka idu-ọdu nile nke Ahitofel di, ma n’ebe Devid nọ ma n’ebe Absalom nọ.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 17

1 Ahitofel we si Absalom, Biko, ka m’rọputa orú nnù ndikom na nnù iri, bilie, chua Devid n’azu n’abali a:

2 m’gābiakwasi kwa ya mb͕e ike gwuru ya onwe-ya, na mb͕e aka-ya nādighi ike, m’gēme kwa ka ọ ma jijiji: ndi nile ndi ya na ha nọ gāb͕alaga kwa; m’gētib͕u kwa eze, nání ya:

3 m’gēme kwa ka ndi-ya nile laghachikute gi: dika nlaghachi madu nile ka nwoke ahu bu, onye gi onwe-gi nāchọ: ndi Israel nile gānọ n’udi.

4 Okwu ahu ziri ezi n’anya Absalom na n’anya ndi-okenye nile nke Israel.

5 Absalom we si, Biko, kpọ kwa Hushai, bú onye-Akait, ka ayi nuru kwa ihe di kwa n’ọnu ya onwe-ya.

6 Hushai we biakute Absalom, Absalom we gwa ya okwu, si, Dika okwu a si di ka Ahitofel kwuru: àyi gēme ihe o kwuru? ọ buru na ayi agaghi-eme ya, gi onwe-gi kwue.

7 Hushai we si Absalom, Ọdu nke Ahitofel duworo ub͕u a adighi nma.

8 Hushai we si, Gi onwe-gi amawo nna-gi na ndikom-ya, na ndi-dike ka ha bu, ndi nkpuru-obi-ha di ilu ka ha bu kwa, dika bear ab͕abara aka nwa n’ọhia: nna-gi bu kwa nwoke agha, ọ gaghi-esoro kwa ndi-ya nọ ọnọdu abali.

9 Le, ub͕u ya onwe-ya ezowo onwe-ya n’otù olùlù ma-ọbu n’otù nime ọnọdu-ya: o gēru kwa, mb͕e ufọdu nime ha dara na nmalite, na onye ọ bula nānu ya gāsi, Ntib͕u di n’etiti ndi ahu nke nēso Absalom.

10 Onye ahu kwa, ọbuná onye bu dìnkpà, onye obi-ya di ka obi ọdum, ọ gāb͕aze ab͕aze: n’ihi na Israel nile amawo na dike ka nna-gi bu, ndi bu dìnkpà ka ha bu kwa, bú ndi ya na ha nọ.

11 Ma anamadu ọdu ka achikọtasia Israel nile n’ebe i nọ site na Dan we rue Bia-sheba, dika ájá nke di n’akuku oké osimiri n’iba-uba: ka iru-gi nēje kwa n’agha ahu.

12 Ayi gābiakute kwa ya n’otù nime ọnọdu ebe agāchọta ya, ayi onwe-ayi gādakwasi kwa ya dika igirigi nādakwasi n’ala: ayi agaghi-eme kwa ka ọbuná otù onye fọdu n’etiti ya na n’etiti ndikom nile ndi ya na ha nọ.

13 Ma ọ buru na achikọta ya n’otù obodo, agēme kwa ka Israel nile chita udọ̀ n’obodo ahu, ayi gādọ kwa ya rue miri-iyi, rue mb͕e agaghi-ahuta ọbuná otù ajirija nkume n’ebe ahu.

14 Absalom na ndikom nile nke Israel we si, Idu-ọdu Hushai, bú onye-Akait, di nma kari idu-ọdu Ahitofel, Ma Jehova nyere iwu imebi ezi idu-ọdu nke Ahitofel, ka Jehova we me ka ihe ọjọ biakwasi Absalom.

15 Hushai we si Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, Otú a na otú a ka Ahitofel duru Absalom na ndi-okenye Israel ọdu; otú a na otú a ka mu onwem du-kwa-ra.

16 Ma ub͕u a ziganu ngwa ngwa, gosi Devid, si, Anọla ọnọdu abali a n’ala ihe nādighi nke ọzara, kama i ghaghi igabiga; ka aghara iloda eze na ndi nile ndi ya na ha nọ.

17 Ma Jonatan na Ahimaaz nēguzo n’En-rogel; nwayi nēje ozi we je gosi ha; ndi ahu we je gosi eze, bú Devid: n’ihi na ọ gaghi-ekwe me, bú ka ahú ka ha ba n’obodo.

18 Otù nwa-okoro we hu ha, gosi, Absalom: ha abua we je ngwa ngwa, ba n’ulo otù nwoke nime Bahurim, onye nwere olùlù-miri n’ogige-ya; ha we rida n’ebe ahu.

19 Nwayi nwe-ulo we were ihe-nkpuchi-ya b͕asa ya n’ọnu olùlù-miri ahu, tusa ọka asuru asu n’elu ya; ma ọ dighi ihe amara.

20 Ndi-orù Absalom we biakute nwayi ahu n’ulo, si, Òle ebe Ahimaaz na Jonatan nọ? Nwayi ahu we si ha, Ha agabigawo iyi miri. Ha we chọ, ma ha achọtaghi ha, ha we lata na Jerusalem.

21 O rue, mb͕e ha lasiri, na ha siri n’olùlù-miri ahu rigota, je, gosi eze, bú Devid; ha we si Devid, Bilienu, gabiga miri ngwa ngwa; n’ihi na otú a ka Ahitofel duworo ọdu megide unu.

22 Devid we bilie, ya na ndi nile ndi ya na ha nọ, ha we gabiga Jọdan; mb͕e ìhè ututu putara ọ dighi onye fọduru nke nāgabigaghi Jọdan.

23 Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n’ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n’ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n’ílì nna-ya.

24 Ma Devid biaruru Mahanaim. Absalom we gabiga Jọdan, ya onwe-ya na ndikom nile nke Israel tiyere ya.

25 Ma Amasa ka Absalom doro onye-isi usu-ndi-agha n’ọnọdu Joab. Ma Amasa bu nwa otù nwoke, aha-ya bu Itra onye Israel, onye bakuru Abigal nwa-nwayi Nehash, nwa-nne-nwayi nke Zeruaia nne Joab.

26 Israel na Absalom we ma ulo-ikwū-ha n’ala Gilead.

27 O rue, mb͕e Devid biaruru Mahanaim, na Shobi nwa Nehash nke Raba umu Amon, na Makia nwa Amiel nke Lo-deba, na Bazilai onye Gilead nke Rogelim,

28 wetara nso Devid, weta kwa nso ndi ya na ha nọ, ihe-ndina, na ọkwa, na ite nke ọkpu-ite kpuru, na ọka wheat, na ọka barley, na utu ọka, na ọka aṅara aṅa, na akidi, na lentil, na ọka aṅara n’oko,

29 na manu-aṅu, na miri-ara-ehi nke raru araru, na ìgwè ewu na aturu, na cheese nke ìgwè ehi, ka ha rie: n’ihi na ha siri, Agu nāgu ndi nka, ha nāda kwa mbà, akpiri nākpọ kwa ha nku, n’ọzara.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 18

1 Devid we gukọta ndi ya na ha nọ, do ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise ichi ha.

2 Devid we zipu ndi ahu, otù uzọ n’uzọ atọ n’aka Joab, na otù uzọ n’uzọ atọ n’aka Abishai nwa Zeruaia, nwa-nne Joab, na otù uzọ n’uzọ atọ n’aka Itai, bú onye Gat Eze we si ndi-ya, Aghaghm iso unu pua, ọbuná mu onwem.

3 Ndi-ya we si, I gaghāpu: n’ihi na ọ buru na ayi ab͕alaga ab͕alaga, ha agaghi-atukwasi ayi obi: ọ buru kwa na nkera nime ayi anwua, ha agaghi-atukwasi ayi obi: n’ihi na ub͕u a orú nnù ndikom na nnù ise dika ayi di; ma ub͕u a ọ di nma ka i buru ayi onye-iye-aka site n’obodo.

4 Eze we si ha, Ihe di nma n’anya-unu ka m’gēme. Eze we guzo n’akuku ọnu-uzọ-ama, ndi-ya nile we nāpu n’ọgu ise ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri.

5 Eze we nye Joab na Abishai na Itai iwu, si, Menu nwayọ n’aru nwa-okorọbia, bú Absalom, n’ihim. Ndi-ya nile nu-kwa-ra mb͕e eze nyere ndi-isi nile iwu bayere Absalom.

6 Ndi-ya we pua je n’ọhia izute Israel: agha ahu we di n’oké ohia Efraim.

7 Ewe tib͕ue ndi Israel n’ebe ahu n’iru ndi-orù Devid, ntib͕u uku we di n’ebe ahu n’ubọchi ahu, bú orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri.

8 Ewe nāb͕asa agha ahu n’ebe ahu n’elu ala ahu nile; oké ọhia ahu we ripia ọtutu madu n’etiti ndi Israel n’ubọchi ahu kari ndi mma-agha ripiara.

9 Absalom we zute ndi-orù Devid. Ma Absalom nānọkwasi n’inyinya mule-ya, inyinya mule ahu we ba n’okpuru alaka tuhiri atuhi nke oké osisi terebinth, isi-ya we kogide n’osisi terebinth ahu, ewe do ya n’etiti elu-igwe na ala; ma inyinya mule ahu nke di n’okpuru ya gabigara.

10 Otù nwoke we hu ya, gosi Joab, si, Le, ahurum Absalom ka ọ kwuru n’osisi terebinth.

11 Joab we si nwoke ahu nke nēgosi ya, Ma, le, i huru ya, ma gini mere i tib͕ughi ya n’ebe ahu rue ala? ọ gābu kwa ọlum inye gi ọla-ọcha iri, na otù ihe-ọkiké.

12 Nwoke ahu we si Joab, Ọ buru kwa na mu onwem ejide n’ọbu-akam nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri, ma m’gaghi-eseti akam imegide nwa eze: n’ihi na ọ bu na nti-ayi ka eze nyere gi na Abishai na Itai iwu, si, Lezienu anya bayere nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, onye ọ bula.

13 Ma asi na emem otú a, m’gēme ihe-ugha megide ndum, (ma ọ dighi okwu ọ bula agēzonari eze,) gi onwe-gi gēguzo kwa onwe-gi n’akuku ọzọ.

14 Joab we si, Ọ bughi otú a ka m’ganēche n’iru gi. O we chiri nkpa-n’aka atọ n’aka-ya, dubà ha n’obi Absalom, mb͕e ọ nānọ na ndu n’etiti osisi terebinth.

15 Umu-okorọbiua iri ndi nēbu ihe-agha Joab we b͕a gburugburu, tib͕ue Absalom, me ka o nwua.

16 Joab we fùa opì-ike, ndi Devid we si n’ichu Israel n’azu lata: n’ihi na Joab b͕ochiri ndi ahu.

17 Ha we were Absalom, tubà ya n’olùlù uku n’oké ọhia ahu, me ka oké obo uku nke nkume guzo n’elu ya: Israel nile we b͕alaga, onye ọ bula n’ulo-ikwū-ya

18 Ma Absalom, mb͕e ọ nọ na ndu, o were ogidi nke di na ndagwurugwu eze guzoro onwe-ya: n’ihi na ọ siri, Enweghm nwa-nwoke ime ka echeta aham: o we kpọ ogidi ahu n’aha-ya: ewe kpọ ya ihe-ncheta Absalom, rue ta.

19 Ahimaaz nwa Zedok we si, Biko, ka m’b͕a ọsọ zìe eze ozi ọma, na Jehova ekpeputawo ya n’aka ndi-iro-ya.

20 Joab we si ya, Ọ bughi onye ozi ọma ka i gābu ta, kama i gēzi ozi ọma ubọchi ọzọ: ma ta i gaghi-ezí ozi ọma, n’ihi na nwa eze anwuwo.

21 Joab we si onye Kush, Je gosi eze ihe i huworo. Onye Kush ahu we kpọ isi ala nye Joab, b͕a ọsọ.

22 Ahimaaz nwa Zedok we si kwa Joab ọzọ, Ma otú ọ di, biko, ka m’b͕a ọsọ, mu onwem kwa, n’azu onye Kush. Joab we si, N’ìhi gini kwa ka gi onwe-gi ganāb͕a ọsọ, nwam, ma ọ dighi ozi ọma ahutara gi.

23 Ma otú ọ di, m’gāb͕a ọsọ, ka o kwuru. Ọ si ya, B͕a ọsọ. Ahimaaz we b͕a ọsọ Buruburu-ala, b͕abiga onye Kush ahu.

24 Ma Devid nānọdu n’etiti ọnu-uzọ-ama abua ahu: onye-nche we jerue elu-ulo ọnu-uzọ-ama rue mbidi obodo, we welie anya-ya, hu, ma, le, otù nwoke nāb͕a ọsọ nání ya.

25 Onye-nche we kpọ òkù, gosi eze. Eze we si, Ọ buru na ọ bu nání ya, ozi ọma di n’ọnu-ya. O we bia si-ike, biarue nso.

26 Onye-nche we hu nwoke ọzọ ka ọ nāb͕a ọsọ: onye-nche we kpọ onye nēche ọnu-uzọ òkù, si, le, nwoke ọzọ nāb͕a ọsọ, nání ya. Eze we si, Onye ahu nēzi kwa ozi ọma.

27 Onye-nche we si, Mu onwem nāhu ọb͕ub͕a-ọsọ nke onye mbu, ọ di ka ọb͕ub͕a-ọsọ Ahimaaz nwa Zedok. Eze we si, Ezi nwoke ka onye ahu bu, ọ bu kwa ezi ozi ọma ka ọ nābia izì.

28 Ahimaaz we kpọ òkù, si eze, Udo. Ọ kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n’ala, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke-gi, bu, Onye mechibidoworo ndikom ahu ndi weliri aka-ha imegide onye-nwem, bú eze.

29 Eze we si, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom: Ahimaaz we si, Ahurum oké ìgwè madu mb͕e Joab zitere orú eze na orù-gi, ma amaghm ihe ọ bu.

30 Eze we si, Chigharia, guzo onwe-gi n’ebe a. O we chigharia, guzo.

31 Ma, le, onye Kush biara; onye Kush we si, Ka ezìe onye-nwem, bú eze, ozi ọma: n’ihi na Jehova ekpeputawo gi ta n’aka ndi nile nēbili imegide gi.

32 Eze we si onye Kush ahu, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom? Onye Kush we si, Ndi-iro onye-nwem, bú eze, na ndi nile ndi biliworo megide gi imejọ gi, ka ha di ka nwa-okorọbia ahu.

33 Eze we ma jijiji nke-uku, rigo rue ulo-elu nke ọnu-uzọ-ama, kwa ákwá: ma otú a ka o siri mb͕e ọ nēje, Nwam Absalom, nwam, nwam Absalom! ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mu onwem anwuwo n’ọnọdu gi, Absalom, nwam, nwam!

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 19

1 Ewe gosi Joab, si, Le, eze nākwa ákwá, nēru-kwa-ra Absalom újú.

2 Nzọputa we ghọrọ ndi Devid nile iru-újú n’ubọchi ahu: n’ihi na ndi Devid nuru n’ubọchi ahu, si, Ọ nēwuta eze n’ihi nwa-ya.

3 Ndi Devid we ghèré bà n’obodo n’ubọchi ahu, dika ndi ihere nēme nēghepu mb͕e ha nāb͕alaga n’agha.

4 Ma eze kpuchiri iru-ya, eze we tie nkpu n’oké olu, si, Nwam Absalom, Absalom, nwam, nwam!

5 Joab we bakuru eze n’ulo, si, I mewo ka ihere me iru ndi-orú-gi nile ta, bú ndi nēwepuga ndu-gi, na ndu umu-gi ndikom na nke umu-gi ndinyom, na ndu ndinyom-i, na ndu ndi-iko-gi nwayi, ta;

6 n’ihu ndi nākpọ gi asi n’anya, na n’ikpọ ndi nāhu gi n’anya asi. N’ihi na i gosiwo ta, na ndi-isi na ndi-orù abughi ihe n’anya-gi: n’ihi na amawom, ta, na asi na Absalom adiwo ndu, asi kwa na ayi nile anwuwo ta, mb͕e ahu o gēzi ezi n’anya-gi.

7 Ma ub͕u a bilie, pua, gwa ndi-orù-gi okwu gāba ha n’obi: n’ihi na aṅuwom iyi na Jehova, na ọ dighi otù nwoke gēsoro gi nọ ọnọdu abali a, ma asi na i gaghi-apu: ma nke ahu gājọrọ gi njọ kari ihe ọjọ nile nke biakwasiworo gi site ka i di na nwata rue ub͕u a.

8 Eze we bilie, nọdu n’ọnu-uzọ-ama. Ha we gosi ndi ya nile, si, Le, eze nānọdu n’ọnu-uzọ-ama: ndi ahu nile we bia n’iru eze.

Ma Israel b͕alagara, nwoke o bula n’ulo-ikwū-ya.

9 Ndi Israel nile we nēse okwu n’ebo nile nke Israel, si, Eze naputara ayi n’ọbu-aka ndi-iro-ayi, ya onwe-ya me kwa-ra ka ayi wepuga onwe-ayi n’ọbu-aka ndi Filistia; ma ub͕u a o siwo n’ala b͕alaga n’ihi Absalom.

10 Ma Absalom, onye ayi tere manu ibu isi-ayi, anwuwo n’agha. Ma ub͕u a n’ihi gini ka unu onwe-unu nādighi-ekwu ime ka eze lata?

11 Eze, bú Devid, we zigara Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, ozi, si, Gwanu ndi-okenye Juda okwu, si, N’ìhi gini ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata n’ulo-ya? ma okwu Israel nile abiaruwo eze nti, ime ka ọ lata n’ulo-ya?

12 Umu-nnem ka unu bu, ọkpukpum na anu-arum ka unu bu: n’ìhi gini kwa ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata?

13 Amasa ka unu gāsi kwa, Ọ̀ bughi ọkpukpum na anu-arum ka i bu? Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na i ghọghi onye-isi usu-ndi-agha n’irum ubọchi nile n’ọnọdu Joab.

14 O we me ka obi ndikom nile nke Juda rulata, dika otù nwoke; ha we zigara eze ozi, si, Lata, gi onwe-gi na ndi-orù-gi nile.

15 Eze we lata, bia rue Jọdan. Juda we biarue Gilgal, ije izute eze, ime ka eze gabiga Jọdan.

16 Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke sitere na Bahurim, we me ngwa soro ndikom Juda ridata izute eze, bú Devid.

17 Nnù ndikom abua na ọgu iri so-kwa-ra ya site na Benjamin; Ziba kwa, onye nējere ulo Sọl ozi, ya na umu-ya ndikom iri na ise na orú ndi-orú-ya; ha we jisie ike gabiga Jọdan n’iru eze.

18 Ma ub͕o-nwebiga gabigara iwebiga ndi ulo eze, na ime ihe di nma n’anya-ya. Shimai nwa Gira we da n’iru eze, mb͕e ọ gabigara Jọdan.

19 Ọ si eze, Ka onye-nwem ghara igu ajọ omume nyem, echeta-kwa-la ihe orù-gi mere n’ajọ omume n’ubọchi onye-nwem, bú eze, siri na Jerusalem pua, ka eze we tiye ya n’obi-ya.

20 N’ihi na orù-gi amawo na mu onwem emehiewo: ma, le, abiawom ta, buru ulo nile nke Josef uzọ irida izute onye-nwem, bú eze.

21 Abishai nwa Zeruaia we za, si, Àgaghi-eme ka Shimai nwua n’ihi nka, n’ihi na ọ kọchara onye Jehova etere manu?

22 Devid we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ, umu-ndikom Zeruaia, na unu gāburum onye-nmegide ta? àgēme ka nwoke ọ bula nwua n’Israel ta? n’ihi na ọ̀ bu na amaghm na ta ka mu onwem bu eze Israel?

23 Eze we si Shimai, I gaghi-anwu. Eze we ṅuara ya iyi.

24 Mefiboshet nwa Sọl rida-kwa-ra izute eze; ma o dozighi ukwu-ya, o dozighi kwa afu-ọnu-ya, ọ sughi kwa uwe-ya miri, site n’ubọchi eze jere rue ubọchi mb͕e ọ bia-kwa-ra n’udo.

25 O rue, mb͕e ọ biaruru Jerusalem izute eze, na eze siri ya, N’ìhi gini ka i nēsoghm je, Mefiboshet?

26 Ọ si, Onye-nwem, eze, orùm ghọb͕urum: n’ihi na orù-gi siri, Ka m’jikwara onwem inyinya-ibu, ka m’we nọkwasi ya, soro eze je; n’ihi na orù-gi dara ngwurọ.

27 O we kwulu orù-gi n’ebe onye-nwem, bú eze, nọ; ma onye-nwem, bú eze, di ka onye-ozi Chineke: gi me kwa ihe di nma n’anya-gi.

28 N’ihi na ulo nnam nile abughi ihe ọ bula ma-ọbughi ndi ọnwu n’iru onye-nwem, bú eze: ma i doro orù-gi n’etiti ndi nēri ihe na table nke gi. Ma èzi omume gini ka m’nwere ọzọ itiku eze nkpu ọzọ?

29 Eze we si ya, N’ìhi gini ka i nēkwu okwu bayere okwu-gi nile ọzọ? Asiwom, Gi onwe-gi na Ziba gēkè ubi ahu.

30 Mefiboshet we si eze, E, ya were ihe nile, ebe onye-nwem, bú eze, biaworo n’ulo-ya n’udo.

31 Bazilai, bú onye Gilead, we si na Rogelim rida; o we soro eze gabiga Jọdan, izilaga ya n’ofè Jọdan.

32 Ma Bazilai mere agadi nke-uku, ọ b͕ara ọgu arọ anọ: ya onwe-ya zù-kwa-ra eze mb͕e ọ nānọdu na Mahanaim; n’ihi na oké madu ka ọ bu nke-uku.

33 Eze we si Bazilai, Gi onwe-gi sorom gabiga, m’gāzù kwa gi n’ebe m’nọ na Jerusalem.

34 Bazilai we si eze, Ùbọchi arọ nke ndum di ole, m’gēji soro eze rigorue Jerusalem?

35 Ọgu arọ anọ ka m’b͕ara ta: m’gāmara ihe di iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọ? òrù-gi gāmata utọ ihe m’nēri ma-ọbu nke m’nāṅu? m’gēge nti ọzọ n’olu ndikom nābu abù na ndinyom nābu abù? n’ihi gini kwa ka orù-gi gāburu onye-nwem, bú eze, ibu ọzọ?

36 Dika ihe ntà orù-gi nēso eze gabiga Jọdan: n’ìhi gini kwa ka eze gēnyeghachim ihe-nnyeghachi a?

37 Biko, ka orù-gi laghachi, ka m’we nwua n’obodom, n’akuku ílì nnam na nnem. Ma, le, orù-gi, bú Kimham; ya soro onye-nwem, bú eze, gabiga; gi me-kwa-ra ya ihe di nma n’anya-gi.

38 Eze we si, Kimham gēsom gabiga, mu onwem gēme-kwa-ra ya ihe di nma n’anya-gi: ma ihe ọ bula i gārọputa ka m’mere gi, m’gēmere gi ya.

39 Ndi Devid nile we gabiga Jọdan, eze gabiga-kwa-ra: eze we sutu Bazilai ọnu, gọzie ya: o we laghachi n’ebe-ya.

40 Eze we gabiga rue Gilgal, Kimham so-kwa-ra ya gabiga: ndi nile nke Juda we me ka eze gabiga, ha na nkera ndi Israel.

41 Ma, le, ndikom nile nke Israel nābiakute eze, we si eze, Gini mere umu-nne-ayi, bú ndikom Juda, zupuru gi n’ori, me ka eze na ulo-ya gabiga Jọdan, na ndikom Devid nile tiyere ya?

42 Ndikom nile nke Juda we za ndikom Israel, si, N’ihi eze di ayi nso n’aru: n’ìhi gini kwa ka iwe-unu di ọku bayere ihe a? àyi eriwo ihe si n’aka eze puta ma-ọli? ọ̀ di onyinye-nri ọ bula o wetara ayi?

43 Ndikom Israel we za ndikom Juda, si, Òkè iri ka ayi nwere n’eze, ọzọ kwa, ayi nwere òkè nime Devid kari unu: gini me-kwa-ra unu lelìri ayi anya, ka okwu-ayi ghara ibu uzọ n’ime ka eze-ayi lata? Ma okwu ndikom Juda siri ike kari okwu ndikom Israel.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 20

1 Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n’ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n’ulo-ikwū-ya, Israel.

2 Ndikom nile nke Israel we si n’iso Devid rigo, so Sheba nwa Bikri: ma ndikom Juda rapara n’aru eze-ha, site na Jọdan we rue Jerusalem.

3 Devid we biarue ulo-ya na Jerusalem; eze we chiri ndinyom iri ahu, bú ndi-iko-ya, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo, o we tiye ha n’ulo-ndebe, nāzu ha, ma ọ bakurughi ha. Ha we buru ndi emechibidoworo uzọ rue ubọchi ọnwu-ha, nādi ndu dika ndinyom di-ha nwuru.

4 Eze we si Amasa, Kpọkọtaram ndikom Juda n’ubọchi atọ, gi onwe-gi guzo kwa n’ebe a.

5 Amasa we je ikpọkọta Juda: ma ọ nọrọ ọdù kari mb͕e akara àkà nke ọ kaworo ya.

6 Devid we si Abishai, Ub͕u a Sheba nwa Bikri gēmejọ ayi kari Absalom: gi onwe-gi chiri ndi-orù onye-mwe-gi, chua ya n’azu, ka o we ghara ichọtara onwe-ya obodo ufọdu ewusiri ike, we naputa onwe-ya n’anya-ayi.

7 Ndikom Joab we soro ya pua, ha na ndi Keret na ndi Pelet, na ndi-dike nile: ha we si na Jerusalem pua, ichu Sheba nwa Bikri n’azu.

8 Mb͕e ndi ahu nọ n’akuku nkume uku nke di na Gibeon, Amasa biara n’iru ha. Ma ekeworo Joab ihe-ọkiké, uwe-nwuda-ya ka o yikwasiri, ihe-ọkiké di kwa n’elu ya, ya na mma-agha ekekọtara n’úkwù-ya n’ọbọ-ya; ma mb͕e Joab putara mma-agha we dapu.

9 Joab we si Amasa, Ọ̀ bu n’udo ka i nọ, nwa-nnem? Joab we were aka-nri-ya jide Amasa n’afu-ọnu isutu ya ọnu.

10 Ma Amasa elezighi anya na mma-agha nke di n’aka Joab: o we were ya tie ya n’okpuru ọgiriga nke-ise, wusi ngiri-afọ-ya n’ala, ma o tighi kwa ya ọzọ; o we nwua. Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, we chua Sheba nwa Bikri n’azu.

11 Ma otù nwoke n’etiti umu-okorọbia Joab guzoro n’akuku ya, si, Onye ọ bula ihe Joab nātọ utọ, na onye ọ bula diri Devid, ya so Joab n’azu.

12 Ma Amasa nāturu n’ọbara n’etiti uzọ atuliri atuli. Nwoke ahu we hu na ndi Israel nile guzoro, o we bupu Amasa n’uzọ atuliri atuli chigharia n’ọhia, tukwasi uwe n’elu ya, mb͕e ọ huru na onye ọ bula nke biara n’ebe ọ di guzoro.

13 Mb͕e ebupusiri ya n’uzọ atuliri atuli, ndikom nile gabigara iso n’azu Joab, ichu Sheba nwa Bikri n’azu.

14 O we gabiga n’ebo nile nke Israel rue Ebel, na Bet-meaka, na ndi Bia nile: ewe kpọkọta ha, ha we bia so kwa ya n’azu.

15 Ha we bia nọchigide ya n’agha n’Ebel Bet-meaka, wukọta ihe-ntukọba imegide obodo ahu, o we guzo nime ékpè: ndi nile soro Joab nēbibimb͕idi, ime ka ọ da.

16 Otù nwayi nke mara ihe we si n’obodo ahu kpọ òkù, si, Nurunu, nurunu; biko, sinu Joab, Biarue nso n’ebe a, ka m’gwa gi okwu.

17 O we biarue ya nso; nwayi ahu we si, Gì onwe-gi bu Joab? Ọ si, Mu onwem bu ya. Nwayi ahu we si ya, Nuru okwu nile nke orù-gi nwayi. Ọ si Anamanu nọ̄.

18 Nwayi ahu we kwue, si, Ha nēkwu ekwu na mbu, si, Ha aghaghi iju ase n’Ebel: otú a ka ha kwuzu-kwa-ra okwu.

19 Mu onwem bu otù onye nime ndi-udo ndi kwesiri ntukwasi-obi n’Israel: gi onwe-gi nāchọ ime ka otù obodo na otù nne n’Israel nwua: n’ìhi gini ka i gēloda ihe-nketa Jehova?

20 Joab we za, si, Ya burum ihe-árú, ya burum ihe-árú; m’gaghi-eloda ma-ọli, m’gaghi-ebibi kwa ma-ọli.

21 Ọ bughi otú a ka okwu a di: kama otù nwoke nke sitere n’ugwu Efraim, Sheba nwa Bikri bu aha-ya, o weliri aka-ya imegide eze, bú imegide Devid: nyenum ya, nání ya, ka m’si n’obodo a la. Nwayi ahu we si Joab, Le, agātuputara gi isi-ya nime mb͕idi.

22 Nwayi ahu we biakute ndi obodo ahu nile n’amam-ihe-ya. Ha we bipu isi Sheba nwa Bikri, tupuru ya Joab. O we fùa opì-ike, ha we si n’obodo ahu b͕asa, nwoke ọ bula ọ la n’ulo-ikwū-ya. Joab we lata na Jerusalem jekuru eze.

23 Ma Joab bu onye-isi usu-ndi-agha nile nke Israel: Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret, bu kwa onye-isi ndi Pelet:

24 Adoram bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè: Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta:

25 Sheva bu ode-akwukwọ: Zedok na Abaiata bu ndi-nchu-àjà.

26 ọzọ kwa, Ira onye Jaia buru Devid onye-isi n’ije ozi.