Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 1

1 O rue, mb͕e ọnwu Sọl gasiri, mb͕e Devid siri na ntib͕u Amalek lata, mb͕e Devid nọwo-kwa-ra na Ziklag ubọchi abua;

2 o rue, nubọchi nke-atọ, na, le, otù nwoke siri n’ọmuma-ulo-ikwū puta, site n’ebe Sọl nọ, uwe-ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi n’isi-ya: o rue, mb͕e ọ biakutere Devid, na ọ daruru ala, we kpọ isi ala.

3 Devid we si ya, Òle ebe i si bia? Ọ si ya, N’ọmuma-ulo-ikwū Israel ka m’wepugara onwem.

4 Devid we si ya, Gini bu ihe emere? biko, gosim. Ọ si, Na ndi Israel esiwo n’agha b͕alaga, ọzọ kwa, ọtutu nime ndi Israel adawo nwua; ọzọ kwa, Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu.

5 Devid we si nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya, Ì si aṅa mara na Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu?

6 Nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya we si, Ọ dabataram inọ n’ugwu Gilboa, ma, le, Sọl nādabere n’ube-ya; ma, le, ub͕o-ala na ndi-nwe inyinya sosiri ya ike.

7 o we gha anya n’azu, hum, we kpọm òkù. M’we si, Lem.

8 Ọ sim, Ònye ka i bu? M’we si ya, Onye Amalek ka m’bu.

9 Ọ sim, Biko, guzo n’akukum, me ka m’nwua, n’ihi na anya-ajù ejidewom: n’ihi na ndum nile dizu nimem.

10 M’we guzo n’akuku ya, me ka ọ nwua, n’ihi na amaram na ọ gaghi-adi ndu mb͕e ọ dasiri: m’were okpu-eze nke di n’isi-ya, na ọla-aka nke di n’ogwe-aka-ya, we chitara ha onye-nwem n’ebe a.

11 Devid we jide uwe-ya, dọwa ha; otú a ka ndikom nile ya na ha nọ me-kwa-ra.

12 Ha we tie aka n’obi, kwa ákwá, bue ọnu rue anyasi, n’ihi Sọl, na n’ihi Jonatan nwa-ya, na n’ihi ndi Jehova, na n’ihi ulo Israel; n’ihi na ha dara site na mma-agha.

13 Devid we si nwa-okorọbia nēgosi ya, Òle ebe i si bia? Ọ si Nwa ọbìa, bú onye Amalek, ka m’bu.

14 Devid we si ya, Ì si aṅa ghara itu egwu iseti aka-gi ibibi onye Jehova etere manu?

15 Devid we kpọ otù nime umu-okorọbia, si, Jerue nso, dakwasi ya. O we tib͕ue ya, o we nwua.

16 Devid we si ya, Ọbara-gi dikwasi n’isi-gi; n’ihi na ọnu-gi azawo megide gi, si, Mu onwem emewo ka ọ nwua, bú onye Jehova etere manu.

17 Devid we were abù-ákwá nka bùara Sọl, bù-kwa-ra Jonatan nwa-ya:

18 Ọ we si ha zi umu Juda abù uta: le, edewo ya n’akwukwọ Jasha.

19 Israel, eb͕uwo nmá-gi n’elu ebe di elu gi!

Ndi-dike esiwo aṅa da!

20 Unu egosila ya nime Gat,

Unu ezisala ozi-ya n’èzí nile nke Ashkelon;

Ka umu-ndinyom ndi Filistia we ghara iṅuri ọṅu,

Ka umu-ndinyom nke ndi anēbìghi úgwù we ghara iṅuri ọṅu-agha.

21 Unu ugwu Gilboa,

Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli:

N’ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi,

Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu.

22 Ọbara ndi eb͕uru eb͕u, abuba ndi-dike,

Uta Jonatan esighi na ha la azu,

Mma-agha Sọl esighi kwa lata n’efu.

23 Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n’anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha,

Ekewaghi kwa ha n’ọnwu-ha;

Ha di garagara kari ugo,

Ha di ike kari ọdum.

24 Umu-ndinyom Israel, kwaranu Sọl ákwá,

Onye nēyibe unu uwe uhie, ya na ihe-utọ di iche iche,

Onye nātukwasi ihe-ichọ-nma ọla-edo n’uwe-unu.

25 Ndi-dike esiwo aṅa da n’etiti agha ahu!

Jonatan, n’elu ebe-gi di elu ka i buru onye eb͕uru eb͕u.

26 Anọm na nkpà n’ihi gi, nwa-nnem Jonatan:

I di utọ nke-uku n’ebe m’nọ:

Ihu-n’anya-gi nke i hurum di ebube,

Kari ihu-n’anya ndinyom.

27 Ndi-dike esiwo aṅa da!

Ihe-agha esiwo aṅa la n’iyì!

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 2

1 O rue, ka nka gasiri, na Devid juru Jehova ese, si, M’gārigo n’otù nime obodo Juda? Jehova we si ya, Rigo. Devid we si, Òle ebe M’gārigo? Ọ si, Rue Hebron.

2 Devid we rigo n’ebe ahu, ya na ndinyom-ya abua kwa, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail, bú nwunye Nebal onye Kamel.

3 Ndikom ndi ya na ha nọ ka Devid me-kwa-ra ka ha rigota, nwoke ọ bula na ulo-ya: ha we biri n’obodo nile nke Hebron.

4 Ndikom Juda we bia te Devid manu n’ebe ahu ibu eze ulo Juda.

Ha we gosi Devid, si, Ndikom Jebesh-gilead bu ndi lìri Sọl.

5 Devid we zigara ndikom Jebesh-gilead ndi-ozi, si, ha, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, na unu emeworo onye-nwe-unu, bú Sọl, ebere a, unu we líe-ya.

6 Ma ub͕u a Jehova mere unu ebere na ezi-okwu: ọzọ kwa, mu onwem gēmeghachiri unu ezi ihe a, n’ihi na unu emewo ihe a.

7 Ma ub͕u a ka aka-unu di ike, buru-kwa-nu ndi-dinkpà: n’ihi na onye-nwe-unu, bú Sọl, anwuwo; ọzọ kwa, mu ka ulo Juda teworo manu ibu eze-ha.

8 Ma Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha Sọl nwere, kuru Ish-boshet nwa Sọl, me ka ọ gabiga rue Mahanaim;

9 o we me ya eze Gilead, na nke ndi-Ashurait, na nke Jezreel, na nke Efraim, na nke Benjamin, na nke Israel nile.

10 (Ish-boshet nwa Sọl b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ malitere ibu eze Israel, o we buru eze arọ abua.) Otù ọ di, ulo Juda soro Devid.

11 Ọnu-ọgugu ubọchi Devid bu eze ulo Juda nime Hebron we di arọ asa na ọnwa isi.

12 Abnea nwa Nea, na ndi-orù Ish-boshet nwa Sọl, we si na Mahanaim puta rue Gibeon.

13 Joab nwa Zeruaia, na ndi-orù Devid, we pua, zute ha n’otù n’akuku ọdọ-miri Gibeon; ha we nọdu, ndi Devid n’otu akuku ọdọ-miri, na ndi Ish-boshet n’akuku nke-ọzọ nke ọdọ-miri.

14 Abnea we si Joab, Biko, ka umu-okorọbia bilie, me ihe-ọchì n’iru ayi. Joab we si, Ka ha bilie.

15 Ha we bilie gabiga n’ọnu-ọgugu; madu iri na abua diri Benjamin, di-kwa-ra Ish-boshet nwa Sọl, na madu iri na abua nime ndi-orù Devid.

16 Ha we jide, nwoke ọ bula o jide isi ibe-ya, we ma mma-agha-ya n’akuku ibe-ya; ha we dakọ n’otù: ewe kpọ aha ebe ahu Helkat-hazurim, nke di na Gibeon.

17 Agha we di ike nke-uku n’ubọchi ahu, ewe tib͕ue Abnea na ndikom Israel n’iru ndi-orù Devid.

18 Umu-ndikom Zeruaia atọ nọ kwa n’ebe ahu, bú Joab, na Abishai, na Asahel: ma ukwu Asahel di nfe n’ib͕a ọsọ dika otù nime mb͕ada nke di n’ọhia.

19 Asahel we chua Abnea n’azu; ma o sighi n’iso Abnea wezuga onwe-ya ije n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe.

20 Abnea we gha anya n’azu, si, Ọ̀ bu gi bu nka, Asahel? Ọ si, Mu ka ọ bu.

21 Abnea we si ya, Wezuga onwe-gi n’aka-nri-gi ma-ọbu n’aka-ekpe-gi, jidere onwe-gi otù nime umu-okorọbia, chiri n’onwe-gi ihe-ya i gāluta. Ma Asahel ekweghi isi n’iso ya wezuga onwe-ya.

22 Abnea we si kwa Asahel ọzọ, Si n’isom wezuga onwe-gi: nìhi gini ka m’gētib͕u gi rue ala? m’gēsi kwa aṅa weliere Joab nwa-nne-gi irum?

23 Ma ọ juru iwezuga onwe-ya: Abnea we were isi ube-ya tie ya n’okpuru ọgiriga-ya nke-ise, ube we puta n’azu ya, o we da n’ebe ahu, nwua n’okpuru ya: o rue, na ndi nile ndi biaruru ebe ahu, bú ebe Asahel dara nwua, guzoro.

24 Ma Joab na Abishai churu Abnea n’azu; anyanwu we da mb͕e ndi ahu biaruru ugwu ntà Ama, nke di n’iru Gia n’uzọ ọzara Gibeon.

25 Umu Benjamin we chikọta onwe-ha iso Abnea n’azu, ha we ghọ otù usu, guzo, n’elu otù ugwu ntà.

26 Abnea we kpọ Joab òkù, si, Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka mma-agha gēripia? ì maghi na ilu ka ọ gādi n’ikpe-azu? rù kwa ole mb͕e ka i nāgaghi-asi ndi-gi ka ha si n’iso umu-nne-ha laghachi?

27 Joab we si, Chineke nādi ndu, ọ buru na i kwughi, n’ezie mb͕e ahu site n’ututu ndim gārigowori, nwoke ọ bula site n’iso nwa-nne-ya.

28 Joab we fùa opì-ike, ndi-ya nile we guzo, ha achughi kwa Israel n’azu ọzọ, ha ebughi kwa agha ọzọ.

29 Ma Abnea na ndikom-ya jere ije n’Araba abali ahu nile; ha we gabiga Jọdan, je ije na Bitron nile, bia rue Mahanaim.

30 Joab we si n’iso Abnea lata: ọ we chikọta ndi-ya nile, ma agukọtara ndikom iri na iteghete na Asahel ndi nādighi n’etiti ndi-orù Devid.

31 Ma ndi-orú Devid tib͕uru ọgu ndikom iri-na-asatọ sitere na Benjamin, na n’etiti ndikom Abnea, ha we nwua.

32 Ha we bulie Asahel, lìe ya n’ílì nna-ya, nke di na Bet-lehem. Joab na ndikom-ya we je ije abali ahu nile, ìhè ututu we putara ha na Hebron.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 3

1 Agha ahu we di ogologo n’etiti ulo Sọl na ulo Devid: ma Devid di ike nāga n’iru, ma ulo Sọl enweghi ike nāla azu azu.

2 Ewe muara Devid umu-ndikom nime Hebron: ọkpara-ya bu Amnon, nke Ahinoam, bú nwayi Jezreel, muru;

3 nwa-ya nwoke nke-abua bu Kileab, nke Abigail nwunye Nebal, bú onye Kamel, muru; nke-atọ bu Absolom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua;

4 nke-anọ bu Adonaija nwa Hagit; nke-ise bu Shefataia nwa Abital;

5 nke-isi bu Itream, nke Egla nwunye Devid muru. Ndia ka amuru Devid nime Hebron.

6 O rue, mb͕e agha di n’etiti ulo Sọl na ulo Devid, na Abnea nēme onwe-ya ka ọ di ike n’ulo Sol.

7 Ma Sọl nwere iko-nwayi, aha-ya bu Rizpa, nwa-nwayi Aia. Ish-boshet we si Abnea, Gini mere i bakuru iko-nwayi nnam?

8 Iwe Abnea we di ọku nke-uku n’ihi okwu Ish-boshet, ọ si, Ọ̀ bu isi nkita nke ulo Juda nwere ka m’bu? Ta ka m’nēmere ulo Sọl, bú nna-gi, nēme-kwa-ra umu-nne-ya, nēme-kwa-ra ndi-eyì-ya, ebere, emeghkwam ka i rue Devid aka, ma i nēbom ebubo ajọ omume bayere nwayi a ta.

9 Chineke me Abnea otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, ma asi na emereghm Devid ọbuná otú a, bú dika Jehova ṅuworo ya iyi;

10 ime ka ala-eze si n’ulo Sọl gabiga, na ime ka oche-eze Devid guzosie ike n’elu Israel na n’elu Juda, site na Dan we rue na Bia-sheba.

11 Ma ọ pughi izaghachi Abnea okwu ọzọ, n’ihi na ọ turu egwu ya.

12 Abnea we zigara Devid ndi-ozi n’ọnọdu ya, si, Ònye nwe ala? ọ si-kwa-ra, Ka mu na gi b͕a ndu, ma, le, akam gādiri gi, ime ka Israel nile chigharia biakute gi.

13 Ọ we si, Ọ di nma; mu onwem na gi gāb͕a ndu: nání, otù ihe ka mu onwem nāju n’aka-gi, si, I gaghi-ahu irum, ma ọ buru na i bughi uzọ me ka Maikal nwa Sọl bia, mb͕e i gābia ihu irum.

14 Devid we zigara Ish-boshet nwa Sọl ndi-ọzi, si, Nyem nwunyem, bú Maikal, onye m’ji ọgu api ise nke ndi Filistia lutara onwem.

15 Ish-boshet we ziga, nara ya n’aka di-ya, bú n’aka Paltiel nwa Laish.

16 Di-ya we soro ya je, nēje nākwa ákwá n’azu ya rue Bahurim. Abnea we si ya, Je, laghachi: o we laghachi.

17 Okwu Abnea we diyere ndi-okenye Israel, si, Na mb͕e gara aga unu nāchọ Devid ka ọ buru eze-unu:

18 Ma ub͕u a menu ya: n’ihi na Jehova ekwuwo okwu bayere Devid, si, M’gēwere aka Devid, bú orùm, zọputa ndim, bú Israel, n’aka ndi Filistia, na n’aka ndi-iro-ha nile.

19 Abnea kwu-kwa-ra na nti Benjamin: Abnea we je kwa ikwu na nti Devid nime Hebron ihe nile nke di nma n’anya Israel, na n’anya ulo Benjamin nile.

20 Abnea we biakute Devid rue Hebron, ya na orú ndikom. Devid we mere Abnea, me-kwa-ra ndikom soro ya, oké oriri.

21 Abnea we si Devid, Ka m’bilie je chikọtara onye-nwem, bú eze, Israel nile, ka gi na ha we b͕a ndu, ka i we buru kwa eze ndi nile nke nkpuru-obi-gi nāchọsi ike. Devid we zilaga Abnea, o we la n’udo.

22 Ma, le, ndi-orù Devid na Joab si n’usu ndi nāpunara madu ihe bia, ọ bu kwa ọtutu ihe-nkwata ka ha bubatara n’aka ha: ma Abnea anọyeghi Devid nime Hebron; n’ihi na o zilagawo ya, o we la n’udo.

23 Joab na usu-ndi-agha nile ndi soro ya we bia, ha we gosi Joab, si, Abnea nwa Nea biakutere eze, o we zilaga ya, o we la n’udo.

24 Joab we biakute eze, si, Gini ka i meworo? le, Abnea biakutere gi; n’ìhi gini ka nka bu, na i zilagawo ya, o we lasia?

25 I mawo Abnea nwa Nea, na ọ bu irafu gi ka ọ biara, ya na imara ọpupu-gi na nbata-gi, na imata ihe nile nke gi onwe-gi nēme.

26 Joab we si n’ebe Devid nọ puta, ziga ndi-ozi n’azu Abnea, ha we me ka o si n’olùlù-miri Saira biaghachi: ma Devid amaghi.

27 Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n’etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n’okpuru ọgiriga-ya nke-ise n’ebe ahu, o we nwua n’ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.

28 Devid we nu nke a mgbe emesiri, ọ si, Ndi puworo n’ọbara Abnea nwa Nea n’iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi ka mu na ala-ezem bu:

29 ka ọ dakwasi n’isi Joab, na n’ulo nna-ya nile; ka aghara kwa ibipu n’ulo Joab onye nwere orùrù n’anu-aru-ya, ma-ọbu onye-ekpenta, ma-ọbu onye nādabere na nkpa-n’aka, ma-ọbu onye nāda site na mma-agha, ma-ọbu onye nri kọrọ.

30 Ma Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, b͕uru Abnea, n’ihi na o mere ka nwa-nne-ha, bú Asahel, nwua nime Gibeon n’agha ahu.

31 Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n’úkwù-unu, tie aka n’obi n’iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu.

32 Ha we lìe Abnea nime Hebron: eze we welie olu-ya kwa ákwà n’ílì Abnea; ndi Israel nile we kwa ákwà.

33 Eze we bùara Abnea abù-ákwà, si,

Ọ̀ bu dika onye-nzuzu nānwu ka Abnea gānwu?

34 Ekeghi aka-gi abua ab͕u, emeghi kwa ka ukwu-gi abua biarue nso ihe ọla eji ke ukwu ab͕u:

Dika onye nāda n’iru ndi ajọ omume, otú a ka i dara.

Ndi Israel nile we kwara ya ákwá ọzọ.

35 Ndi ahu nile we bia ime ka Devid rie nri mb͕e ubọchi fọduru; ma Devid ṅuru iyi, si, Chineke mem otú a, me kwa ihe ọzọ otú a, ọ buru na edetum nri ọnu, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ, tutu ọdida-anyanwu.

36 Ndi-ya nile we mata, ọ di nma n’anya-ha: dika ihe ọ bula eze mere di nma n’anya ndi-ya nile.

37 Ndi-ya nile na Israel nile we mara n’ubọchi ahu na o siteghi n’aka eze ime ka Abnea nwa Nea nwua.

38 Eze we si ndi-orù-ya, Únu amaghi na onye-isi na onye uku adawo n’Israel ta?

39 Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 4

1 Ish-boshet nwa Sọl we nu na Abnea anwuwo nime Hebron, aka-ya we kuda, Israel nile ma-kwa-ra jijiji.

2 Ma Ish-boshet nwa Sọl nwere ndikom abua ndi bu ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe: aha otù bu Beana, aha nke-ọzọ bú Rikab, ha bu umu Rimon onye Beirot, sitere n’umu Benjamin: (n’ihi na anāgu-kwa-ra Benjamin, Beirot:

3 ndi Beirot we b͕alaga na Gitaim, buru ndi-ọbìa n’ebe ahu rue ta.)

4 Ma Jonatan nwa Sọl nwere nwa-nwoke nke dara ngwurọ n’ukwu-ya abua. Ọ b͕ara arọ ise mb͕e akukọ Sọl na Jonatan siri na Jezreel bia, nwayi nāzù ya we kuru ya, b͕alaga: o rue, mb͕e ọ nēme ngwa ib͕alaga, na nwata ahu dara ada, we ghọ onye-ngwurọ. Aha-ya bu Mefiboshet.

5 Umu Rimon onye Beirot, bú Rikab na Beana, we je, biarue ulo Ish-boshet dika n’ikpo-ọku nke ehihie, ma ya onwe-ya nēdina ndina etiti-ehihie.

6 Ma n’ebe ahu ka ha biara rue etiti ulo, dika ha nēwere ọka wheat; ha we tie ya n’okpuru ọgiriga nke-ise: Rikab na Beana, bú nwa-nne-ya, we wepuga onwe-ha.

7 Ma mb͕e ha batara n’ulo, ka ya onwe-ya nēdina n’ihe-ndina-ya n’ime-ulo-ndina-ya, ha we tib͕ue ya, me ka ọ nwua, wezuga isi-ya, were isi-ya, je ije n’uzọ Araba abali ahu nile.

8 Ha we butere Devid isi Ish-boshet rue Hebron, si eze, Le, isi Ish-boshet nwa Sọl, bú onye-iro-gi, nke chọrọ ndu-gi; ma Jehova abọworo onye-nwem, bú eze, ọ́bọ̀ ta n’aru Sọl, na n’aru nkpuru ya.

9 Devid we za Rikab na Beana nwa-nne-ya, bú umu Rimon onye Beirot, si ha, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile,

10 mb͕e otù onye nēgosim, si, Le, Sọl anwuwo, ma onye ahu n’anya ya onwe-ya di ka onye nēzi ozi ọma, m’we jide ya, b͕ue ya na Ziklag, nka bu ihe m’nyere ya bayere ozi ọma ahu.

11 M’gēsi aṅa ghara ime kari otúa, mb͕e ndikom ndi nēmebi iwu b͕uworo onye ezi omume n’ulo-ya n’elu ihe-ndina-ya? Ma ub͕u a m’gaghi-ajuta ọbara-ya n’aka-unu kpochapu unu n’uwa?

12 Devid we nye umu-okorọbia-ya iwu, ha we b͕ue ha, bipu aka-ha na ukwu-ha, kwuba ha n’akuku ọdọ-miri nime Hebron. Ma ha were isi Ish-boshet, lìe ya n’ílì Abnea nime Hebron.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 5

1 Ebo Israel nile we biakute Devid rue Hebron, kwue, si, Le, ọkpukpu-gi na anu-aru-gi ka ayi bu.

2 Na mb͕e gara aga, mb͕e Sọl bu eze-ayi, gi onwe-gi bu onye nēdupu na onye nēdubata Israel: Jehova we si gi, Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel onwe-gi gābu kwa onye-ndú Israel.

3 Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na eze, bú Devid, we b͕a ndu nime Hebron n’iru Jehova: ha we te Devid manu ibu eze Israel.

4 Onye b͕ara orú arọ na iri ka Devid bu mb͕e ọ malitere ibu eze, ọgu arọ abua ka ọ bu eze.

5 Na Hebron ka ọ bu eze Juda arọ asa na ọnwa isi: na Jerusalem ka ọ bu kwa eze Israel na Juda nile orú arọ na iri na atọ.

6 Eze na ndikom-ya we jerue Jerusalem jekuru ndi Jebus, bú ndi bi n’ala ahu: ha we gwa Devid okwu, si, I gaghi-abata n’ebe a, kama ndi-ìsì na ndi-ngwurọ gēme ka i wezuga onwe-gi: nāsi, Devid agaghi-abata n’ebe a.

7 Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid.

8 Devid we si n’ubọchi ahu, Onye ọ bula nke netib͕u ndi Jebus, ya jerue ebe miri si aga, we tib͕ue ndi-ngwurọ na ndi-ìsì, bú ndi nkpuru-obi Devid nākpọ asì. N’ihi nka ka ha nāsi, Ndi-ìsì na ndi-ngwurọ nọ; ọ gaghi-abà n.ulo.

9 Devid we biri n’ebe ahu ewusiri ike, o we kpọ ya obodo Devid. Devid we wue obodo gburugburu site na Milo we rue n’ime-ya.

10 Devid we nāga n’iru, nēje nādi uku; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nọye-kwa-ra ya.

11 Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà n’osisi, na ndi-ọ̀kà na nkume: ha we wuere Devid ulo.

12 Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, ọ ma-kwa-ra na O buliwo ala-eze-ya n’elu n’ihi ndi-Ya, bú Israel.

13 Devid we si na Jerusalem kuru ndi-iko nwayi na ndinyom ọzọ, mb͕e o siri na Hebron biasi: ewe muara Devid umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ

14 Ndia bu kwa aha ndi amuru ya na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon,

15 na Ibha, na Elishua; na Nefeg, na Jafia;

16 na Elishama, na Eliada, na Elifelet.

17 Ndi Filistia we nu na ha tere Devid manu ibu eze Israel, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid; Devid we nu ya, rida n’ebe ahu ewusiri ike.

18 Ma ndi Filistia biara, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.

19 Devid we jua Jehova ase, si, M’gārigokuru ndi Filistia? Ì gēnye ha n’akam? Jehova we si Devid, Rigo: n’ihi na aghaghm inye ndi Filistia n’aka-gi.

20 Devid we biarue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n’ebe ahu; o we si, Jehova ekwopuwo megide ndi-irom n’irum, dika nkwopu miri. N’ihi nka ka ọ kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.

21 Ha we rapu arusi nile ha n’ebe ahu, Devid na ndikom-ya we chiri ha.

22 Ndi Filistia we rigo kwa ọzọ, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.

23 Devid we jua Jehova ese, O si, Arigola: ga gburugburu rue n’azu ha, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam.

24 O gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n’elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gēme ngwa: n’ihi na mb͕e ahu ka Jehova puworo n’iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia.

25 Devid we me otú a, dika Jehova nyere ya iwu; o we tib͕ue ndi Filistia site na Geba rue ebe i nāba Gezea.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 6

1 Devid we chikọta kwa ndikom nile arọputara arọputa n’Israel, orú nnù madu uzọ atọ na nnù iri-na-ise.

2 Devid we bilie, si na Beale Juda je, ya na ndi Israel nile ndi ya na ha nọ, isi n’ebe ahu bugota ib͕e Chineke, nke akpọkwasiri Aha, bú aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha Onye nānọkwasi cherubim.

3 Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n’ulo Abinadab nke di n’ugwu ntà: Uza na Ahio, bú umu Abinadab, we nēdu ub͕ọ-ala ọhu ahu.

4 Ha we buputa ya n’ulo Abinadab nke di n’ugwu ntà, ya na ib͕e Chineke: Ahio we nēje n’iru ib͕e ahu.

5 Devid na ulo Israel nile nēgwu egwū n’iru Jehova, were ihe nile eji osisi fir me, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na castanet, na ájà.

6 Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Nakon, Uza we setia aka-ya rue ebe ib͕e Chineke di, jide ya, n’ihi na ehi nāb͕a ukwu.

7 Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n’ebe ahu n’ihi nmehie-ya; o we nwua n’ebe ahu n’akuku ib͕e Chineke.

8 Iwe Devid we di ọku n’ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: ọ we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta.

9 Devid we tua egwu Jehova n’ubọchi ahu; ọ si, Ìb͕e Jehova gēsi aṅa biakutem?

10 Devid ekweghi kwa iwezugara onwe-ya ib͕e Jehova rue obodo Devid; ma Devid buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat.

11 Ib͕e Jehova we nọdu n’ulo Obed-edom, bú onye Gat, ọnwa atọ: Jehova we gọzie Obed-edom na ulo-ya nile.

12 Ewe gosi eze, bú Devid, si, Jehova agọziwo ulo Obed-edom na ihe nile o nwere, n’ihi ib͕e Chineke. Devid we were ọṅu je, si n’ulo Obed-edom bugota ib͕e Chineke n’obodo Devid.

13 O rue, mb͕e ndi nēbu ib͕e Jehova zọrọ nzọ-ukwu isi, na ọ churu ehi na nwa-ehi mara abuba n’àjà.

14 Devid were kwa ike-ya nile te egwún’iru Jehova; ewere ephod ákwà ọcha ke Devid n’ukwù.

15 Devid na ulo Israel nile we were iti-nkpu, were kwa olu opì-ike, nēbugota ib͕e Jehova.

16 O rue, mb͕e ib͕e Jehova batara n’obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēte kwa egwú, n’iru Jehova; o we leda ya anya n’obi-ya.

17 Ha we bubata ib͕e Jehova, guzo ya n’ọnọdu-ya, n’etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: Devid we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n’iru Jehova.

18 Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n’aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha.

19 O we kesara ndi Israel nile, bú ìgwè nile nke Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otú ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami. Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n’ulo-ya.

20 Devid we lata igọzi ulo-yaz. Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, we puta izute Devid, si, Le, otú eze Israel di nsọpuru nke-uku ta, onye kpupuru uwe n’aru-ya ta n’anya ndi-orù-nwayi nke ndi-orù-ya, dika otù nime ndikom efu nēkpupu uwe n’aru-ya ekpupu!

21 Devid we si Maikal, Ọ bu n’iru Jehova, Onye rọputaramn kari nna-gi, kari kwa ulo-ya nile, inyem iwu ibu onye-ndú ndi Jehova, bú Israel: m’we gwú egwu n’iru Jehova.

22 Ma m’gēweta-kwa-ra onwem nkọcha kari nka, m’gādi kwa ala n’anyam: ma ndi orù-nwayi ndi i kwuru okwu bayere ha, n’etiti ha ka agāsọpurum.

23 Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, o nweghi nwa rue ubọchi ọnwu-ya.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 7

1 O rue, mb͕e eze biri n’ulo-ya, mb͕e Jehova me-kwa-ra ka o zuru ike pua n’aka ndi-iro-ya nile buruburu,

2 na eze siri Netan, bú onye-amuma, Biko, le, Mu onwem nēbi n’ulo cedar, ma ib͕e Chineke nēbi n’etiti ákwà-nkwuba.

3 Netan we si eze, Ihe nile nke di n’obi-gi, je, me ya; n’ihi na Jehova nọyere gi.

4 O rue, n’abali ahu, na okwu Jehova ruru Netan nti, si,

5 Je, si orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu gi onwe gi gēwurum ulo ibu ebe M’gēbi?

6 N’ihi na ebighm n’ulo site n’ubọchi M’mere ka umu Israel si n’Ijipt rigota, we rue ta, kama M’nējeghari n’ulo-ikwū na n’ebe-obibim.

7 N’ebe nile nke M’nējeghari n’etiti umu Israel nile, ọ̀ di okwu M’gwara otù n’ebo Israel nile, nke M’nyere iwu izù ndim, bú Israel, si, N’ìhi gini ka unu newurughm ulo cedar?

8 Ma ub͕u a, otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n’ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n’ebe i nēso ìgwé ewu na aturu, kuru gi, ka i buru nye-ndú ndim, bú Israel:

9 M’we nọyere gi n’ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n’iru gi; M’gēme-kwa-ra gi aha uku, dika aha ndi uku ndi nọ n’uwa.

10 M’gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otú ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n’ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eweda kwa ha ọzọ, dika na mbu,

11 na dika site n’ubọchi mb͕e M’nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel; emewokwam ka i zuru ike pua n’aka ndi-iro-gi nile. Jehova egosiwo kwa gi na Jehova gēmere gi ulo.

12 Mb͕e ubọchi-gi zuru, mb͕e gi gēsoro nna-gi-hà dina kwa n’ọnwu, M’gēme kwa ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, nke gēsi n’afọ-gi puta, M’gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.

13 Onye ahu gēwuru aham ulo, M’gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.

14 Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe ya gābu-kwa-ram nwa: ọ buru na ọ me ajọ omume, M’gēwere nkpa-n’aka madu, were kwa ihe-otiti nke umu madu, dua ya ọdu;

15 ma eberem agaghi-esi n’ebe ọ nọ wezuga onwe-ya, dika M’wēzugara ya n’ebe Sọl nọ, onye M’wezugara n’iru gi.

16 Ma ulo-gi na ala-eze-gi gēkwesi ntukwasi-obi n’iru gi rue mb͕e ebighi-ebi: agēme ka oche-eze-gi buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.

17 Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu.

18 Eze, bú Devid, we ba, nọdu ala n’iru Jehova; ọ si, Ònye ka m’bu, Onye-nwe-ayi Jehova, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m’biarue na mb͕e a?

19 Ma nka bu nání ihe ntà n’anya-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova; I we kwu kwa okwu bayere ulo-orú-Gi rue mb͕e di anya; nka bu kwa iwu bayere madu, Onye-nwe-ayi Jehova!

20 Ma gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ? n’ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova.

21 N’ihi okwughi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka orù-Gi mara ya.

22 N’ihi nka I di uku, Onye-nwe-ayi Jehova: n’ihi na ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.

23 Ma òle mba di ka ndi-Gi, dika Israel, bú otù mba nke nēguzo iche n’uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ka ọ buru otù ndi, na imere Onwe-ya aha, na imere unu ihe-idi-uku a, na imere ala-Gi ihe di egwu, n’iru ndi-Gi, nke I siri n’Ijipt, bú mba di iche iche ọzọ na chi nile ha, baputara onwe-gi?

24 I we me ndi-Gi, bú Israel, ka o guzosiere Gi ike, iburu Gi otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke.

25 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, me ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo.

26 Ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu Chineke Israel: agēme kwa ka ulo orù-Gi, bú Devid, guzosie ike n’iru Gi.

27 N’ihi na Gi onwe-gi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, I kpughewo nti orù-Gi, si, M’gēwu-kwa-ra gi ulo: n’ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpere Gi ekpere a.

28 Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi Jehova, Gi onwe-gi bu Chineke onwe-ya, okwu-Gi nile bu kwa ezi-okwu, I gwawo kwa orù-Gi ezi ihe a:

29 ma ub͕u a kwere igọzi ulo orù-Gi, ka o we dirue mb͕e ebighi-ebi n’iru Gi: n’ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, ekwuwo ya: ka ewere kwa ngọzi-Gi nāgọzi ulo orù-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 8

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Devid tib͕uru ndi Filistia, me kwa ka ha ruru ala: Devid we nara n’aka ndi Filistia bridle nke isi obodo-ha.

2 O tib͕u-kwa-ra Moab, were udọ̀-ọtùtù tùa ha, me ha ka ha dina ala; o we tùa udọ̀-ọtùtù abua ime ka ha nwua, na udọ̀ ọtùtù zuru ezu ime ka ha di ndu. Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma.

3 Devid tib͕u-kwa-ra Hedadeza nwa Rehob, bú eze Zoba, mb͕e ọ nēje iweghachi ike-ya n’akuku Osimiri.

4 Devid we napu n’aka-ya nnù ndi-inyinya anọ na ọgu ise, na orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje: Devid bipu-kwa-ra nkwonkwo-ukwu inyinya ub͕ọ-ala nile, ma o kwere ka ọgu inyinya ub͕ọ-ala ise fọdu n’etiti ha.

5 Siria Damaskọs we bia iyere Hedadeza, bú eze Zoba, aka, Devid we tib͕ue n’etiti ndi Siria orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise.

6 Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs: Siria we ghọrọ Devid ndi-orú, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.

7 Devid we chiri ọta ọla-edo nke dikwasiri ndi-orù Hedadeza, chita ha na Jerusalem.

8 Eze, bú Devid, we si na Beta, si kwa na Birotai, bú obodo Hedadeza, chiri ọtutu ọla nke-uku.

9 Toi, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedadeza,

10 Toi we zíe Joram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n’ihi na o busoworo Hedadeza agha, we tib͕ue ya: n’ihi na nwoke nke nēbuso Toi agha nke-uku ka Hadadeza bu. Ihe ọla-ọcha na ihe ọla-edo na ihe ọla di kwa n’aka Joram inye ya:

11 ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo nke o doro nsọ site na mba nile nke o budara;

12 site na Siria, site kwa na Moab, site kwa n’umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n’Amalek, site kwa n’ihe-nkwata Hedadeza, nwa Rehob, bú eze Zoba.

13 Devid we mere onwe-ya aha mb͕e o siri n’itib͕u Siria nime Ndagwurugwu Nnù lata, bú orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise.

14 O tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n’Edom: n’Edom nile ka o tiyere ebe-nguzo-ndi-agha, Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula ọ jere.

15 Devid we buru eze Israel nile; Devid we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere n’ikpe na ezi omume.

16 Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta:

17 Zedok nwa Ahaitub, na Ahimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Seraia bu ode-akwukwọ;

18 Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n’ije ozi.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 9

1 Devid we si, Ọ̀ di onye ọ bula fọduru ọzọ nye ulo Sọl, ka m’we mere ya ebere n’ihi Jonatan?

2 Ulo Sọl nwere otù orù, aha-ya bu Ziba, ha we kpọ ya biakute Devid; eze we si ya, Gì onwe-gi bu Ziba? Ọ si, Orù-gi bu ya.

3 Eze we si, Ọ̀ dighi nwoke fọduru ulo Sọl ọzọ, ka m’we mere ya ebere Chineke? Ziba we si eze, Otù nwa-nwoke fọduru Jonatan, nke dara ngwurọ n’ukwu-ya abua.

4 Eze we si ya, Òle ebe ọ nọ? Ziba we si eze, Le, Onye ahu nọ n’ulo Makia nwa Amiel, nime Lodeba.

5 Eze, bú Devid, we ziga kuputa ya n’ulo Makia nwa Amiel, site na Lo-deba.

6 Mefiboshet, nwa Jonatan, nwa Sọl, we biakute Devid, da kpue iru-ya n’ala, kpọ isi ala. Devid we si, Mefiboshet, Ọ si, Le orù-gi!

7 Devid we si ya, Atula egwu; n’ihi na aghaghm imere gi ebere n’ihi Jonatan, bú nna-gi, m’gēweghachi-kwa-ra gi ubi nile nke Sọl nna-gi; gi onwe-gi gēri kwa nri na table nkem mb͕e nile.

8 Ọ kpọ isi ala, si, Gini ka orù-gi bu, na i gēche iru n’ebe nkita nwuru anwu dikam nọ?

9 Eze we kpọ Ziba, onye buri nwa-okorọbia Sọl, si ya, Ihe nile Sọl na ulo-ya nile nwere ka m’nyeworo nwa onye-nwe-gi.

10 I gālu-kwa-ra ya ọlu ala-ubi, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na ndi-orù-gi; i gēwebata kwa nkpuru ọ miri, ka nwa onye-nwe-gi we nwe nri ọ gēri: ma Mefiboshet nwa onye-nwe-gi gēri nri na table nkem mb͕e nile. Ma Ziba nwere umu-ndikom iri na ise na orú ndi-orù.

11 Ziba we si eze, Dika ihe nile si di, nke onye-nwem, bú eze, nyere orù-ya n’iwu, otú a ka orù-gi gēme. Eze we si, Ma Mefiboshet ganēri ihe na table nkem, dika otù nime umu eze.

12 Mefiboshet nwe-kwa-ra otù nwatakiri-nwoke, aha-ya bu Maika. Ma ndi nile ndi bi n’ulo Ziba buru Mefiboshet ndi-orù.

13 Mefiboshet we biri na Jerusalem’ n’ihi na ọ bu na table eze ka ọ nēri ihe mb͕e nile; ma ya onwe-ya dara ngwurọ n’ukwu-ya abua.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 10

1 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na eze umu Amon nwuru, Hanun nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

2 Devid we si, M’gēmere Hanun nwa Nehash ebere, dika nna-ya merem ebere. Devid we ziga ikasi ya obi bayere nna-ya site n’aka ndi-orú-ya. Ndi-orù Devid we ba n’ala umu Amon.

3 Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, bú onye-nwe-ha, Devid, ọ́ nāsọpuru nna-gi n’anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa obodo a, na iledo ya, na ikwatu ya, ka Devid zitere ndi-orù-ya ibiakute gi?

4 Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu nkera nke afu-ọnu-ha, bipu kwa uwe-nwuda-ha n’etiti, rue otule-ha, we zilaga ha.

5 Ha we gosi Devid, o ziga izute ha; n’ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata.

6 Umu Amon we hu na ha nēsì Devid ísì ọjọ, umu Amon we ziga, go Siria Bet-rehob na Siria Zoba, orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri ndi ji ukwu eje, na eze Meaka, ya na nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndikom Tob, bú orú nnù ndikom na nnù iri.

7 Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike.

8 Umu Amon we puta, do agha n’usoro n’oghere ọnu-uzọ-ama: Siria Zoba, na Rehob, na ndikom Tob, na Meaka, nọrọ onwe-ha n’ọhia.

9 Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n’etiti ndi nile arọputara arọputa n’Israel, do ha n’usoro izute Siria:

10 o tiye ndi Israel fọduru n’aka Abishai, bú nwa-nne-ya, we do ha n’usoro izute umu Amon.

11 Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m’gābia kwa izọputa gi.

12 Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n’ihi ndi-ayi, na n’ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n’anya-Ya.

13 Joab na ndi soro ya we biarue agha ahu nso imegide Siria: ha we b͕alaga n’iru ya.

14 Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n’iru Abishai, ba n’obodo. Joab we si n’ebe umu Amon nọ lata, biarue Jerusalem.

15 Siria we hu na etib͕uru ha n’iru Israel, ha we chikọta onwe-ha n’otù.

16 Hedareza we ziga, me ka Siria ndi nọ n’ofè Osimiri puta: ha we biarue Hilam, Shobak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n’iru ha.

17 Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biarue Hilam. Siria we do onwe-ha n’usoro izute Devid, ha we buso ya agha.

18 Siria we b͕alaga n’iru Israel; Devid we b͕ue n’etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri-na-ise, na orú nnú ndi-inyinya uzọ ise; o tib͕u-kwa-ra Shobak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, o we nwua n’ebe ahu.

19 Eze nile, bú ndi-orù Hedareza, we hu na etib͕uru ha n’iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Israel di n’udo, we fè ha òfufè. Siria we tua egwu izọputa umu Amon ọzọ.