Categories
II. NDI TESALỌNAIKA

II. NDI TESALỌNAIKA 1

1 Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ:

2 Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

3 Ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi, dika o kwesiri, n’ihi na okwukwe-unu nāba uba nke-uku, ihunanya ahu unu nile n’otù n’otù nāhurita ibe-unu nēri kwa nne;

4 ya mere ayi onwe-ayi nānya isi n’aru unu n’etiti nzukọ Chineke nile n’ihi ntachi-obi-unu na okwukwe-unu nime nsob͕u-unu nile na nime nkpab͕u nile unu nānagide;

5 nke bu ihe nēme ka ikpé ziri ezi nke Chineke puta ìhè; ka ewe gua unu na ndi kwesiri ala-eze Chineke, nke unu nāhu kwa ahuhu n’ihi ya:

6 asi na ọ bu ezie na o ziri ezi n’ebe Chineke nọ inyeghachi ndi nākpab͕u unu nkpab͕u,

7 na inyeghachi unu, bú ndi anākpab͕u, aru-efè, ayi na unu, nime nkpughe nke Onye-nwe-ayi Jisus site n’elu-igwe, Ya na ndi-mọ-ozi nke ike-Ya,

8 nime ọku nēre ere, nābọ̀ ọ́bọ̀ n’aru ndi nāmataghi Chineke, ha na ndi nāṅaghi nti ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus:

9 bú madu ndi gāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpe ziri ezi, bú nbibi ebighi-ebi nke sitere n’iru Onye-nwe-ayi, site kwa n’ebube nke ike-Ya,

10 mb͕e ọ bula Ọ gabia ka ewe nye Ya otuto nime ndi nsọ Ya, ka ibobo-Ya we nwu kwa ihe nile n’aru nime ndi kwereri ekwe (n’ihi na ekwere àmà ayi b͕ara unu) n’ubọchi ahu.

11 Ọ bu kwa nka ka ayi ji nēkpe kwa ekpere bayere unu mb͕e nile, ka Chineke-ayi we gua unu na ndi kwesiri ọkpukpọ akpọrọ unu, ka O were kwa ike mezu ihe nile ọ bula nke diri idi-nma ezi nma na ọlu nile ọ bula nke okwukwe;

12 ka ewe nye aha Onye-nwe-ayi Jisus otuto nime unu, nye kwa unu onwe-unu otuto nime Ya, dika amara nke Chineke-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist si di.

Categories
II. NDI TESALỌNAIKA

II. NDI TESALỌNAIKA 2

1 Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, n’ihi ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na nzukọ ayi gēzukọ n’ebe Ọ nọ;

2 ka ewe ghara isite n’aka mọ, ma-ọbu okwu, ma ọbu akwukwọ-ozi di ka o sitere n’aka-ayi, me ka unu me nkpatu pua n’uche-unu ọsọsọ, ma-ọbu ka unu tua ujọ, dika agāsi na ubọchi Onye-nwe-ayi di ub͕u a:

3 unu ekwela ka onye ọ bula ghọb͕ue unu n’uzọ ọ bula: n’ihi na ọ gaghi-adi, ma ọ buru na nwezuga ahu ebughi uzọ bia, ewe kpughe onye ahu nēmebi iwu, bú nwa nke ila-n’iyì,

4 onye nēmegide nēweli kwa onwe-ya elu imegide ihe nile anākpọ Chineke ma-ọbu nke bu ihe anāsọpuru dika Chineke; ya mere ọ nānọdu n’ulo nsọ nke Chineke, nēgosi onwe-ya si na ya bu Chineke.

5 Ùnu echetaghi, na, mb͕e m’nānọ n’etiti unu n’oge gara aga, ọ bu ihe ndia ka m’nāgwa unu?

6 Ub͕u a unu matakwara ihe nēb͕ochi, ka ewe kpughe ya n’oge nke aka ya.

7 N’ihi na ihe-omimi nke nmebi-iwu nālusi ọlu ike ub͕u a: nání rue mb͕e agēwepu onye ahu n’etiti, bú onye nēb͕ochi ub͕u a.

8 Mb͕e ahu ka agēkpughe kwa onye ahu nēmebi iwu, onye Onye-nwe-ayi Jisus gēwere iku-ume nke si n’ọnu-Ya puta b͕ue, were kwa ngosi nke ọbibia-Ya me ka ọ ghara idi irè;

9 bú onye ahu, nke ọbibia-ya di ka ilusi-ọlu-ike nke Setan n’ike nile ọ bula na ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche nke ugha,

10 n’aghughọ nile kwa nke ajọ omume n’ebe ndi nāla n’iyì nọ; n’ihi na ha anaraghi ihu-n’anya nke ezi-okwu nke-ọma, ka ewe zọputa ha.

11 N’ihi nka Chineke nēzitekwara ha ilusi-ọlu-ike nke njehie, ka ha kwere ugha ahu:

12 ka ewe kpe ha nile ikpé, bú ndi nēkweghi ezi-okwu, kama ajọ omume diri ha ezi nma.

13 Ma ayi onwe-ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi ndi Onye-nwe-ayi huru n’anya, n’ihi na Chineke rọputara unu site na mbu ka unu we nwe nzọputa nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ nēdo na ikwere ezi-okwu:

14 nke O sitere n’aka ozi ọma ayi kpọbata unu nime ya, ka unu we nweta ebube nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

15 Ya mere otú a, umu-nna-ayi, nēguzosinu ike, jidekwanu ozizí nile enyere n’aka idebe nke ezíri unu, ma-ọbu site n’okwu-ọnu-ayi, ma-ọbu site n’akwukwọ-ozi-ayi.

16 Ma ka Ya onwe-ya, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na Chineke, bú Nna-ayi, Onye huru ayi n’anya nye kwa ayi nkasi-obi ebighi-ebi na ezi olile-anya nime amara,

17 ka Ọ kasie obi-unu, me kwa ka ha guzosie ike n’ezi ọlu na ezi okwu nile ọ bula.

Categories
II. NDI TESALỌNAIKA

II. NDI TESALỌNAIKA 3

1 Nke fọduru, umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi, ka okwu Onye-nwe-ayi we b͕a ọsọ, ka ewe nye kwa ya otuto, otú ọ di kwa n’etiti unu;

2 ka ewe dọputa kwa ayi n’aka ajọ madu ndi nēmehie kwa; n’ihi na ọ bughi madu nile nwere okwukwe.

3 Ma Onye-nwe-ayi bu onye kwesiri ntukwasi-obi, Onye gēme ka unu guzosie ike, che kwa unu ka unu ghara idabà n’aka ajọ onye ahu.

4 Ma ayi atukwasiwo obi n’aru unu nime Onye-nwe-ayi, na unu nēme, gēme kwa, ihe nile ayi nēme n’iwu.

5 Ma Onye-nwe-ayi duzie obi-unu bà n’ihunanya nke Chineke, bà kwa na ntachi-obi nke Kraist-ayi.

6 Ma ayi nēnye unu iwu, umu-nna-ayi, n’aha nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka unu nēze nwa-nna ọ bula nādighi-agazi ije, ọ dighi-eje kwa dika ozizí ahu enyere n’aka-ha idebe nke ha natara n’aka-ayi.

7 N’ihi na unu onwe-unu matara otú unu nāghaghi iṅomi ayi: n’ihi na ayi abughi ndi nādighi-agazi ije n’etiti unu;

8 ayi erighi kwa nri n’aka onye ọ bula n’efu, kama n’idọb͕u onye-ayi n’ọlu na ihuju-anya, nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu:

9 ọ bughi na ayi enweghi ike, ma ọ bu ka ayi we were onwe-ayi mere unu ihe-atù, ka unu we ṅomi ayi.

10 N’ihi na mb͕e ayi nọ n’etiti unu, ọ bu kwa nka ka ayi nēnye unu n’iwu, si, Ọ buru na onye ọ bula achọghi ilu ọlu, ya ghara kwa iri ihe.

11 N’ihi na ayi nuru okwu bayere ufọdu ndi nādighi-alu ọlu ọ bula, kama ha nētiye aka n’ọlu nke nābughi nke aka ha.

12 Ma ndi di otú a ka ayi nēnye iwu nāriọ kwa aririọ nime Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka ha were nwayọ nālu ọlu, ri kwa nri nke aka ha.

13 Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ike agwula unu n’obi n’ime ihe ọma.

14 Ma ọ buru na onye ọ bula aṅaghi nti okwu ayi ji akwukwọ-ozi a kwu, ribanu onye ahu ama, ka unu ghara iso ya mekọ ihe, ka ewe me ya ihe-ihere n’iru.

15 Unu agukwala ya n’onye-iro, kama nādunu ya ọdú dika nwa-nna.

16 Ma Ya onwe-ya, bú Onye-nwe udo, Ya nye unu udo mb͕e nile n’uzọ nile. Ka Onye-nwe-ayi nọyere unu.

17 Ekele nke mu Pọl nke m’ji aka nkem de, nke bu ihe-iriba-ama n’akwukwọ-ozi nile ọ bula: otú a ka m’nēde.

18 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu nile.