Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 11

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na unu gānagidem n’okwu ntà nke sitere n’enweghi-uche: ma unu nānagidem n’ezie.

2 N’ihi na ejim ekworo Chineke nēkworo unu: n’ihi na ejikọrọm unu na otù di, ka m’we che unu n’iru Kraist dika nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú nke anēmerughi.

3 Ma anamatu egwu, ma ọ nwere uzọ ọ bula agēmebi uche-unu ka unu pua n’afọ-ofufo na idi-ọcha nke di n’ebe Kraist nọ, dika agwọ ahu were aghughọ-ya ghọb͕ue Iv.

4 N’ihi na asi na onye ahu nke nābia nēkwusa Jisus ọzọ, onye ayi nēkwusaghi, ma-ọbu asi na unu nānara mọ di iche, nke unu nānaraghi, ma-ọbu ozi ọma di iche, nke unu nānaraghi nke-ọma, unu nānagide ya nke-ọma.

5 N’ihi na anamagu na ọ dighi uzọ ọ bula m’nērughi ndi kachasi elu n’etiti ndi-ozi.

6 Ma asi na ọ bu ezie na abum onye nāmutaghi akwukwọ n’uzọ ikwu okwu, ma abughi m otú a n’uzọ ihe-ọmuma; kama ayi mere ka ọ puta ìhè nye unu n’ihe nile ọ bula n’etiti madu nile.

7 Ma-ọbu ọ̀ bu nmehie ka m’mehiere, mb͕e m’wedara onwem n’ala ka ewe welie unu onwe-unu elu, n’ihi na ezirim unu ozi ọma nke Chineke n’onyinye-efu?

8 Anapurum ihe n’aka nzukọ Kraist ọzọ, nānara ha ego-ọlu ka m’we jere unu ozi;

9 mb͕e m’nọ-kwa-ra n’etiti unu, nọ kwa na nkpà, abughi m onye ọ bula ibu arọ́; n’ihi na umu-nna-ayi, mb͕e ha si na Masedọnia bia, ha mezuru ihe nke fọdurum inwe; edebe-kwa-ram onwem n’uzọ nile ọ bula ka m’ghara inyib͕u unu, otú a ka m’gēdebe kwa onwem.

10 Dika ezi-okwu nke Kraist di nimem, agaghi-eb͕ochi inya-isi a nimem n’akuku nile nke Akaia.

11 N’ìhi gini? ọ̀ bu n’ihi na ahughi m unu n’anya? Chineke matara.

12 Ma ihe m’nēme ka m’gēme kwa, ka m’we bipuru ndi nāchọ ihe ha gēji megidem ihe ahu ha ji megidem; ha ewe hu na ha di kwa ka ayi onwe-ayi n’ihe ha nānya isi.

13 N’ihi na madu di otú a bu ndi-ozi ugha, ndi-ọlu nātu ntu, ndi nēme onwe-ha ka ha yie ndi-ozi Kraist.

14 Ọ bughi kwa ihe iju anya; n’ihi na Setan onwe-ya nēme onwe-ya ka o yie mọ-ozi nke ìhè.

15 Ya mere ọ bughi ihe uku ma asi na ndi nējere ya ozi nēme kwa onwe-ha ka ha yie ndi nēje ozi ezi omume; ndi ọgwugwu-ha gādi ka ọlu-ha si di.

16 Asim ọzọ, Ka madu ọ bula ghara ichè na abum onye nēnweghi uche: ma ọ buru na unu emeghi otú a, otú ọ di naranum nke-ọma dika onye nēnweghi uche, ka mu onwem we nya kwa isi nke-ntà.

17 Ihe m’nēkwu, ekwughi m dika Onye-nwe-ayi gēkwu, kama ọ bu dika n’enweghi-uche, n’ihe m’dabere we nānya isi.

18 Ebe ọtutu madu nānya isi n’uzọ anu-aru, mu onwem gānya kwa isi.

19 N’ihi na unu were obi-utọ nānagide ndi nēnweghi uche, ebe unu nwere uche.

20 N’ihi na unu nānagide ya, ma ọ buru na onye ọ bula eme ka unu buru orù, ọ buru na onye ọ bula eripia unu, ọ buru na onye ọ bula ejide unu, ọ buru na onye ọ bula eweli onwe-ya elu, ọ buru na onye ọ bula apia unu ihe n’iru.

21 Anamekwu okwu bayere ebubo ihere eboro ayi, dika nka, na ayi onwe-ayi bu ndi nādighi ike. Ma n’uzọ ọ bula onye ọ bula nwere anya-ike (ọ bu n’enweghi-uche ka m’nēkwu), mu onwem nwe-kwa-ra anya-ike.

22 Hà bu ndi-Hibru? mu onwem bu kwa. Hà bu ndi Israel? mu onwem bu kwa. Hà bu nkpuru Abraham? mu onwem bu kwa.

23 Hà bu ndi nējere Kraist ozi? (anamekwu dika onye anya nādighi nma) mu onwem nēje kari; anamadọb͕ubiga onwem ókè n’ọlu kari, anamanọbiga ókè n’ulo-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n’ọnu ọnwu ọtutu mb͕e.

24 Ub͕ò ise ka ndi-Ju piaram otù adighi n’ọgu ube-utari abua.

25 Ub͕ò atọ ka apiaram utari, otù ub͕ò ka aturum nkume, ub͕ò atọ ka ub͕ọ m’nọ nime ya kpùru, otù ubọchi abali na ehihie ka m’nọworo nime ob͕u-miri;

26 n’ije ọtutu mb͕e, n’ize-ndu site n’osimiri, n’ize-ndu site na ndi nāpunara madu ihe, n’ize-ndu site na ndi mba nkem, n’ize-ndu site na ndi mba ọzọ, n’ize-ndu nime obodo, n’ize-ndu nime ọhia, n’ize-ndu nime oké osimiri, n’ize-ndu n’etiti umu-nna ugha;

27 n’idọb͕u onwem n’ọlu na ihuju-anya, n’imu-anya ọtutu mb͕e, n’oké agu na akpiri-ikpọ-nku, n’obubu-ọnu ọtutu mb͕e, n’oyi na ib͕a-ọtọ.

28 Nāgughi ihe di n’èzí, ihe ahu di nke nānyib͕um kwa-ubọchi, bú ncheb͕u m’nēcheb͕u onwem bayere nzukọ Kraist nile.

29 Ònye nādighi ike, nke mu onwem nēsoghi ya n’adighi-ike? ònye ka anēme ka ọ ma n’ọnyà, nke mu onwem nēreghi ọku n’ihi ya?

30 Ọ buru na aghaghi m inya isi, m’gānya isi n’ihe nke diri adighi-ikem.

31 Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus, Onye bu onye agọziri agọzi rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọ matara na ekwughi m okwu-ugha.

32 Nime Damaskọs onye-isi ala nke nọ n’okpuru Aretas, bú eze, nēche obodo ndi Damaskọs nche, ijidem:

33 site kwa na window ka esi na mb͕idi radam n’ihe akpara akpa, m’we b͕apu n’aka-ya.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 12

1 Aghaghi m inya isi, ọ bu ezie na ọ baghi urù; ma m’gēche iru n’ọhù na ihe-nkpughe nke Onye-nwe-ayi.

2 Amataram otù madu nime Kraist, arọ iri na anọ gara aga (ma ọ bu nime aru, amataghi m; ma-ọbu na ọ bughi nime aru, amataghm; Chineke matara), na eweliri madu di otú a na mberede rue elu-igwe nke-atọ.

3 Amata-kwa-ram madu di otú a (ma ọ bu nime aru, ma-ọbu na aru anọghi ya, amataghi m; Chineke matara),

4 na eweliri ya rigo na Paradais na mberede, o we nu okwu nke anāpughi ikwu, nke o nēzighi ezi n’iwu ka madu kwue ha.

5 M’ganānya isi bayere onye di otú a: ma m’gaghi-anya isi bayere mu onwem, ma-ọbughi n’adighi-ikem nile.

6 N’ihi na asi na agamachọ inya isi, m’gaghi-abu onye nēnweghi uche; n’ihi na m’gēkwu ezi-okwu: ma esepurum aka, ka onye ọ bula we ghara igu ihe bayerem kari ihe ọ huru na abum, ma-ọbu nke ọ nuru n’ọnum.

7 N’ihi ọkika nke nkpughe ndia-n’ihi ya, ka ewe ghara iwelibigam ókè, enyerem ogwu n’anu-arum, bú mọ-ozi nke Setan, ka o we tiem aka, ka ewe ghara iwelibigam ókè.

8 Ub͕ò atọ ka m’riọrọ Onye-nwe-ayi aririọ bayere ihe a, ka ọ pua n’arum.

9 Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n’ihi na emewo ka ikem zu oké n’adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m’gēwere obi-utọ nile nya isi n’adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.

10 N’ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n’ihi Kraist dim ezi nma: n’ihi na mb͕e ọ bula m’nādighi ike, mb͕e ahu ka m’nādi ike.

11 Aghọwom onye nēnweghi uche: unu onwe-unu rugiderem; n’ihi na ugwọ unu ji mu onwem bu ime ka amaram: n’ihi na ọ dighi uzọ ọ bula m’nērughi ndi kachasi elu n’etiti ndi-ozi, asi na ọ bu ezie na abughi m ihe ọ bula.

12 Ewere ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube na ọlu di ike di iche iche luputa ihe-iriba-ama nile nke onye-ozi n’etiti unu ezie na ntachi-obi nile.

13 N’ìhi na gini bu ihe ahu nke emere ka unu la ala nime ya kari nzukọ Kraist fọduru, ma-ọbughi na mu onwem abughi unu ibu arọ́? b͕agharanum ajọ omume a.

14 Le, nka bu ub͕ò nke-atọ m’nọ dika onye edoziworo ibiakute unu; m’gaghi-abu kwa ibu arọ́: n’ihi na achọghi m ihe-unu, kama ọ bu unu onwe-unu: n’ihi na ọ bughi ọlu umu ikpadoro ndi muru ha ihe, kama ọ bu ọlu ndi muru umu ikpadoro umu-ha.

15 Ma mu onwem gēwere obi-utọ nile mefu ihe m’nwere kwe kwa ka emefusia mu onwem n’ihi nkpuru-obi-unu. Ọ buru na anamahubiga unu n’anya ókè kari, ànāhum n’anya nke-ntà kari?

16 Ma ka ọ di otú a, mu onwem eboghi unu ibu arọ́; kama, ebe m’bu onye-aghughọ, ejim itu-ntu nwude unu.

17 Ọ̀ gābu na esim n’aka onye ọ bula n’etiti ndi m’ziteworo unu rib͕u unu?

18 Ariọrọm Taitọs, ziga kwa nwa-nna-ayi ahu ka o so ya. Ọ̀ gābu na Taitọs rib͕uru unu n’uzọ ọ bula? àyi eweghi otù Mọ ahu jeghari? àyi esoghi n’otù ije-ukwu ahu?

19 Unu nēchè oge nile a na ayi nāgọpu onwe-ayi nye unu. Ọ bu n’iru Chineke nime Kraist ka ayi nēkwu. Ma ihe nile bu n’ihi iwuli unu elu dika ulo, ndi m’huru n’anya.

20 N’ihi na anamatu egwu, ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m’gābia, m’gāhu unu ka unu nābughi aha madu ahu m’nāchọ, unu ahú kwa mu onwem ka m’nābu aha madu unu ṅachọghi; ma o nwere uzọ ọ bula esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkwutọ, ntakwu, nfuli-elu, aghara, gādi;

21 ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m’gābia ọzọ, Chinekem gēwedam n’ala n’iru unu, m’ru-kwa-ra ọtutu madu újú n’etiti ndi mehieworo n’oge gara aga, ha echègharighi kwa n’adighi-ọcha na ikwa-iko na agu ikwa-iko nke ha mere.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 13

1 Nka bu ub͕ò nke-atọ m’nābiakute unu. N’ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ ka agēme ka okwu nile ọ bula guzo.

2 Agwawom ha n’oge gara aga, anamebu kwa uzọ gwa ha, bú ndi mehieworo n’oge gara aga, na ndi nile fọduru, dika mb͕e m’nọ n’etiti unu ub͕ò nke-abua, ub͕u a kwa, mb͕e m’nānọghi n’etiti unu, si, na, ọ buru na abiam ọzọ, m’gaghi-eme ebere;

3 ebe unu nāchọ ihe inwaputa Kraist Onye nēkwu okwu nimem; Onye nābughi onye nādighi ike n’ebe unu nọ, kama Ọ di ike nime unu:

4 n’ihi na esitere n’adighi-ike kpọgide Ya n’obe, ma O sitere n’ike Chineke nādi ndu. N’ihi na ayi onwe-ayi bu kwa ndi nādighi ike nime Ya, ma ayi gēsite n’ike Chineke n’ebe unu nọ so Ya di ndu.

5 Nānwanu onwe-unu, ma unu di n’okwukwe-ayi; nānwaputanu onwe-unu. Ma-ọbu ùnu amazughi onwe-unu, na Jisus Kraist nọ nime unu? ma-ọbughi na ọ bu ezie na unu bu ndi ajuru aju.

6 Ma anamele anya na unu gāmara na ayi onwe-ayi abughi ndi ajuru aju.

7 Ma ayi nēkpere Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọ ọ bula; ọ bughi ka ayi onwe-ayi we puta ìhè, na ayi bu ndi anwaputara, kama ka unu onwe-unu we nēme ihe ọma, ka ayi onwe-ayi we di kwa ka ndi ajuru aju.

8 N’ihi na ayi apughi ime ihe ọ bula megide ezi-okwu, kama ayi nēmere ezi-okwu ihe nile.

9 N’ihi na ayi nāṅuri ọṅu, mb͕e ọ bula ayi onwe-ayi nādighi ike, ma unu onwe-unu di ike: nka ka ayi nēkpe-kwa-ra Chineke, bú ka eme ka unu zu okè.

10 N’ihi nka ka m’nēde ihe ndia n’akwukwọ mb͕e m’nānọghi n’etiti unu, ka m’we ghara iwere ihe-ike meso unu mb͕e m’nọ n’etiti unu, dika ike nke Onye-nwe-ayi nyerem si di, iwuli elu dika ulo, ọ bughi kwa ikwada akwada.

11 Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu. Ka anēme unu ka unu zu okè; ka anākasi unu obi; nātukwasinu uche-unu nile n’otù ihe; nādinu n’udo: Chineke nke ihu-n’anya na udo gānọye-kwa-ra unu.

12 Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu.

13 Ndi nsọ nēkele unu.

14 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n’anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile.