Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n’ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, ha na ndi nsọ nile ndi nọ n’Akaia dum:

2 Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

3 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile;

4 Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.

5 N’ihi na dika ahuhu nile Kraist huru nābabiga ókè n’ebe ayi nọ, otú a ka nkasi-obi-ayi nābabiga kwa ókè site n’aka Kraist.

6 Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n’ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n’ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n’itachi obi n’otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa:

7 olile-anya-ayi bayere unu nēguzosi kwa ike; ebe ayi matara na, dika unu bu ndi nēnwekọ ahuhu nile, otú a ka unu nēnwekọ kwa nkasi-obi ahu.

8 N’ihi na, umu-nnam, ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere nkpab͕u-ayi nke akpab͕uru ayi n’Esia, na esob͕uru ayi nke-uku ri nne, kari ike-ayi, ya mere ayi nwebigara obi abua ókè ma ayi gādi kwa ndu:

9 e, ayi onwe-ayi enwewo ọziza azara nime onwe-ayi na ọ bu ọnwu, ka ayi we ghara itukwasi obi n’onwe-ayi, kama ọ bu na Chineke Onye nēme ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie:

10 Onye dọputara ayi n’oké ọnwu di otú a, Ọ gādọputa kwa ayi: Onye ayi leworo anya Ya na Ọ ganādọputa kwa ayi ọzọ;

11 ebe unu nēyekọ kwa aka n’ihi ayi n’aririọ-unu; ka ọtutu madu we kele ekele n’ihi ayi bayere onyinye-amara enyeworo ayi site n’aka ọtutu madu.

12 N’ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n’idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n’amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n’amara Chineke, ka ayi biri obi n’uwa, ma ọ bu n’ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.

13 N’ihi na ayi edegaraghi unu ihe ọzọ n’akwukwọ, ma-ọbughi ihe unu nāghọta ma-ọbu nke unu nāmazu kwa, anamele kwa anya na unu gāmazu ha rue ọgwugwu ihe nile:

14 dika unu mazu-kwa-ra ayi n’otù akuku, na ayi bu ihe-inya-isi-unu, ọbuná dika unu onwe-unu bu kwa ihe-inya-isi nke ayi, n’ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus.

15 Nime ntukwasi-obi a ka m’zube-kwa-ra na mbu ibiakute unu, ka unu we nwe amara nke-abua;

16 ka m’we site kwa n’iye-aka-unu je rue Masedọnia, si kwa na Masedọnia biakute unu ọzọ, ka unu we dupukwam n’ijem iga Judia.

17 Ya mere mb͕e m’zubere nka, ọ̀ gābu na ejim uche nāgha agha zube? ma-ọbu ihe m’nēzuputa, ànamezuputa ha dika anu-aru nāgwam, ka e e na é-è é-è we di n’ọnum n’otù oge?

18 Ma dika Chineke kwesiri ntukwasi-obi, okwu-ayi nke ayi gwara unu abughi e na é-è.

19 N’ihi na Ọkpara Chineke, Jisus Kraist, Onye ekwusara n’etiti unu site n’ọnu-ayi, bú site n’ọnu nkem na nke Silvanọs na nke Timọti, emeghi Ya ka Ọ buru e na é-è, kama emewo ka e di nime Ya.

20 N’ihi na ka ha ra, bú nkwa nke Chineke, ọ bu nime Ya ka e di: n’ihi nka ka Amen site-kwa-ra n’aka-Ya, ka ewe site n’aka-ayi nye Chineke otuto.

21 Ma Onye ahu Nke nēme ka ayi na unu guzosie ike nime Kraist, Onye te-kwa-ra-ayi manu n’isi, bu Chineke;

22 Onye ka-kwa-ra ayi akàrà, nye kwa ayi Mọ Nsọ n’obi-ayi, bú ihe ayi ji mara na ayi gēnwezu nkwa ahu nile.

23 Ma mu onwem nākpọku Chineke ka Ọ buru onye-àmà megide nkpuru-obim, na ọ bu n’imere unu ebere ka m’nējighi bia Kọrint rue ub͕u a.

24 Ọ bughi na ayi bu ndi-nwe okwukwe-unu, kama ayi bu ndi soro unu nālu ọṅù-unu: n’ihi na unu ji okwukwe-unu guzo.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 2

1 Ma ezuputaram onwem nka, na m’gaghi-abiakute unu ọzọ n’ihe-nwuta.

2 N’ihi na asi na mu onwem eme ka o wuta unu, ònye bu kwa onye gēme ka obi tọm utọ, ma-ọbughi onye ahu nke anēme ka o wuta ya site na mu onwem?

3 Ede-kwa-ram otù ihe nka n’akwukwọ, ka m’we ghara inwe ihe-nwuta mb͕e m’biara n’aka ndi o kwesiri ka m’ṅuria ọṅu n’aru ha; ebe m’tukwasiworo obi n’ebe unu nile nọ, na ọṅùm bu ọṅù nke unu nile.

4 N’ihi na m’sitere na nkpab͕u na ihe-nb͕u nke obi riri nne were ọtutu anya-miri degara unu akwukwọ; ọ bughi ka eme ka o wuta unu, kama ka unu we mara ihu-n’anya nke m’hubigara unu ókè kari.

5 Ma ọ buru na onye ọ bula emewo ka o wuta ayi, ọ bughi mu onwem, kama, n’otù akuku (ka m’ghara idọb͕u unu nke-uku) ọ bu unu nile ka o meworo ka o wuta.

6 O zuworo madu di otú a, bú nba nka nke ndi ka n’ọnu-ọgugu nime unu bara ya;

7 ya mere, kama ibara ya nba ọzọ anamachọ ka unu were amara b͕aghara ya kasi kwa ya obi, ka aghara iji ihe-nwuta nke nēwutabiga ya ókè loda madu di otú a n’uzọ ọ bula.

8 N’ihi nka ariọm unu ka unu me ka ihu-n’anya unu huru ya buru ihe di itukwasi obi.

9 N’ihi na ihe mere m’degara unu akwukwọ bu kwa nka, ka m’we mara nnwaputa unu, ma unu bu ndi nāṅa nti rue ihe nile.

10 Ma onye ọ bula unu were amara b͕aghara ya ihe ọ bula, mu onwem were kwa amara b͕aghara ya: n’ihi na ihe mu onwem werewo-kwa-ra amara b͕aghara, ma ọ buru na ewerewom amara b͕aghara ihe ọ bula, ọ bu n’ihi unu ka m’meworo ya n’iru Kraist;

11 ka Setan we ghara irib͕u ayi: n’ihi na ayi abughi ndi nāmaghi ihe nile ọ nēchèputa.

12 Ma mb͕e m’biaruru Troas izisa ozi ọma Kraist, mb͕e emeghereri kwa ọnu-uzọ nime Onye-nwe-ayi nyem,

13 mọm adighi nfé ma-ọli, n’ihi na ahughi m Taitọs nwa-nnam: kama ekelerem ha ekele ikpe-azu, we pua je Masedọnia.

14 Ma ekele diri Chineke, Onye nēdughari ayi n’ọṅù-agha nime Kraist mb͕e nile, nēsite kwa n’aka-ayi egosi isìsì nke ọmuma-Ya n’ebe nile.

15 N’ihi na ayi bu isìsì utọ nke Kraist n’ebe Chineke nọ, n’etiti ndi anāzọputa, na n’etiti ndi nāla n’iyì;

16 n’ebe ndia nọ ọ bu isìsì nke sitere n’ọnwu we dubà n’ọnwu; n’ebe ndi ahu anāzọputa nọ ọ bu isìsì nke sitere na ndu we dubà na ndu. Ma ònye ruru ime ihe ndia?

17 N’ihi na ayi adighi ka ọra madu, ndi were ihe nādighi nma nētigwa n’okwu Chineke: kama dika ndi sitere n’idi-ọcha, kama dika ndi sitere na Chineke, ọ bu n’iru Chineke, nime Kraist ka ayi nēkwu.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 3

1 Àyi nāmalite ọzọ ime ka madu mara ayi? ma-ọbu ǹkpà akwukwọ-ozi ime ka madu mara ayi nākpa ayi inye unu ma-ọbu inara unu, dika ọ nākpa ufọdu?

2 Unu onwe-unu bu akwukwọ-ozi-ayi, nke edeworo nime obi-ayi, nke madu nile mara nāgu kwa;

3 ebe emere ka unu puta ìhè na unu bu akwukwọ-ozi Kraist, nke ayi jere ozi ya, nke anējighi ink de, kama ọ bu Mọ nke Chineke di ndu ka eji de ya; ọ bughi n’elu mbadamba nkume, kama ọ bu n’elu mbadamba ihe di iche, bú obi nke anu-aru.

4 Ntukwasi-obi di otú a ka ayi nwe-kwa-ra site n’aka Kraist n’ebe Chineke nọ:

5 ọ bughi na ayi ruru n’onwe-ayi, igu ihe ọ bula dika o sitere n’onwe-ayi; kama iru-eru-ayi sitere na Chineke;

6 Onye me-kwa-ra ayi ka ayi rue ibu ndi nēje ozi ọb͕ub͕a-ndu ọhu; ọ bughi nke ihe edeworo n’akwukwọ, kama ọ bu nke Mọ Nsọ: n’ihi na ihe ahu edeworo n’akwukwọ nēb͕u eb͕u, ma Mọ ahu nēnye ndu.

7 Ma ọ buru na ije-ozi nke ọnwu, nke edeworo n’akwukwọ, nke atuworo n’elu nkume, biara n’ebube, nke mere umu Israel apughi ilegide iru Moses anya n’ihi ebube nke iru-ya; ebube nke anēme ka ọ ghara idi irè:

8 ìje-ozi nke Mọ Nsọ gēsi aṅa ghara idi kari n’ebube?

9 N’ihi na asi na ije-ozi nke ọmuma-ikpé bu ebube, ije-ozi nke ezi omume gēnwebiga ebube ókè kari nke-uku.

10 N’ihi na ihe emeworo ka ọ di ebube, emeghi ya ka ọ di ebube n’akuku a n’ezie, n’ihi ebube ahu nke kariri nke-uku.

11 N’ihi na asi na ihe anēme ka ọ ghara idi irè ji ebube bia, ihe nādigide dikariri n’ebube nke-uku.

12 Ya mere ebe ayi nwere olile-anya di otú a, ayi nēkwuwa okwu nke-uku,

13 ayi adighi kwa ka Moses, onye nēkpudo ihe-nkpudo n’iru-ya, ka umu Israel we ghara ilegide anya rue ọgwugwu ihe ahu anēme ka ọ ghara idi irè:

14 ma emere ka uche-ha ma etili: n’ihi na rue ubọchi ta n’ọgugu ọb͕ub͕a-ndu ochie otù ihe-nkpudo ahu nādigide, ebe anēkpugheghi na anēme ya ka ọ ghara idi irè nime Kraist.

15 Ma rue ubọchi ta, mb͕e ọ bula anāgu akwukwọ Moses, ihe-nkpudo nādigide n’obi-ha.

16 Ma mb͕e ọ bula o gēchigharikute Onye-nwe-ayi, ewepu ihe-nkpudo ahu.

17 Ma Onye-nwe-ayi bu Mọ ahu: ma ebe Mọ nke Onye-nwe-ayi nọ, n’ebe ahu ka madu nwere onwe-ha.

18 Ma ayi onwe-ayi nile ebe ayi were iru nke ekpupuworo ihe-nkpudo nēgosi ebube nke Onye-nwe-ayi dika enyo, anēnwogha ayi rue n’otù onyinyo ahu site n’ebube rue ebube, ọbuná dika anēnye ya site n’Onye-nwe-ayi, bú Mọ Nsọ.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 4

1 N’ihi nka, ebe ayi nwere ije-ozi a, dika emere ayi ebere, ike agwughi ayi n’obi:

2 kama ayi juru ihe-nzuzo nile nke nēweta ihere, ayi adighi-ejeghari n’aghughọ, ayi adighi-emeso kwa okwu Chineke n’uzọ itu-ntu; kama ayi ji ngosi nke ezi-okwu nēme ka akọ-na-uche nke madu nile n’otù n’otù mara ayi n’iru Chineke.

3 Ma asi kwa na ekpudoworo ozi ọma ayi ihe, ọ bu n’etiti ndi nāla n’iyì ka ekpudoworo ya:

4 ndi chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndi nēkweghi ekwe kpu ìsì n’etiti ha, ka inye-ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraist, Onye bu onyinyo Chineke, we ghara iwakwasi ha.

5 N’ihi na ọ bughi ayi onwe-ayi ka ayi nēkwusa, kama ọ bu Kraist Jisus, na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ayi nāsi kwa na ayi onwe-ayi bu ndi-orù-unu n’ihi Jisus.

6 N’ihi na ọ bu Chineke, Onye siri, Ìhè gēsi nime ọchichiri nwuputa, bu Onye nwubàra nime obi-ayi, iweta inye-ìhè nke ọmuma nke ebube nke Chineke n’iru nke Jisus Kraist.

7 Ma ayi nwere àkù a n’ite ájá, ka ọkika nke ike ahu we buru nke Chineke, ghara kwa isite n’ayi onwe-ayi;

8 anākpab͕u ayi n’akuku nile, ma adighi-akpab͕ubiga ayi ókè; ayi nwere obi abua, ma ayi adighi-enwebiga obi abua ókè;

9 anēsob͕u ayi, ma adighi-arapu nání ayi; anātuda ayi n’ala, ma adighi-ala ayi n’iyì;

10 ayi nēbughari n’aru-ayi mb͕e nile ob͕ub͕u nke Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n’aru-ayi.

11 N’ihi na arara ayi onwe-ayi, bú ndi di ndu, nye n’aka ọnwu mb͕e nile n’ihi Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n’anu-aru-ayi nke puru inwu anwu.

12 Ya mere ọnwu nālusi ọlu ike nime ayi, ma ndu nālusi ọlu ike nime unu.

13 Ma ebe ayi nwere otù mọ nke okwukwe ahu, dika ihe edeworo n’akwukwọ nsọ si di, Ekwerem, n’ihi ya ka m’kwuru; ayi onwe-ayi kwere kwa, ọ bu kwa n’ihi ya ka ayi nēkwu;

14 ebe ayi matara na Onye ahu Nke mere ka Onye-nwe-ayi Jisus si n’ọnwu bilie, na Ọ gēme kwa ka ayi so Jisus si n’ọnwu bilie, Ọ gēche kwa ayi na unu n’iru Onwe-ya.

15 N’ihi na ihe nile di n’ihi unu, ka amara, ebe o riri nne site n’aka ndi ka n’ọnu-ọgugu, ka o we me ka ikele-ekele babiga ókè rue ebube nke Chineke.

16 N’ihi nka ike agwughi ayi n’obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi.

17 N’ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi;

18 ebe ayi nādighi-ele ihe anāhu anya, kama ihe anādighi-ahu anya: n’ihi na ihe anāhu anya nādiru nwa oge; ma ihe anādighi-ahu anya di ebighi-ebi.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 5

1 N’ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n’elu-igwe.

2 N’ihi na ayi nāsu udè nime ulo nka ezie, ebe ọ nāgusi ayi ike ka ewere ebe-obibi-ayi nke sitere n’elu-igwe yikwasi ayi n’elu ya:

3 ebe ọ bu na agāhu ayi ndi eyiworo ihe, ndi nāb͕aghi ọtọ.

4 N’ihi na ayi, bú ndi nọ n’ulo-ikwū a, ayi nāsu udè ezie, ebe ọ nānyib͕u ayi; n’ihi na ayi achọghi ka eyipu ayi ya, kama ka eyikwasi ayi ihe n’elu ya, ka ndu we loda ihe puru inwu anwu.

5 Ma Onye luputara ayi ka ewe me otù ihe a bu Chineke, Onye nyere ayi Mọ Nsọ, bú ihe ayi ji mara na agēmezuru ayi ya.

6 Ya mere ayi nēnwe obi-ike mb͕e nile, mata kwa na mb͕e ayi nọ n’ulo n’aru-ayi, ayi anọghi n’ulo n’ebe Onye-nwe-ayi nọ:

7 (n’ihi na ayi sitere n’okwukwe nējeghari, ọ bughi n’ọhuhu-uzọ);

8 ayi nēnwe obi-ike, ka m’kwuru, ọ di kwa ayi ezi nma kari ka ayi ghara inọ n’ulo n’aru-ayi, ka ayi nọ kwa n’ulo n’ebe Onye-nwe-ayi nọ.

9 N’ihi nka ayi nējisi kwa ike ka ayi we buru ndi di Ya ezi utọ, ma ayi nọ n’ulo ma-ọbu na ayi anọghi n’ulo.

10 N’ihi na aghaghi ime ka ayi nile puta ìhè n’iru oche-ikpé Kraist; ka ayi nile n’otù n’otù we nāghachi íhe esitere n’aru me, dika ihe onye ọ bula mere si di, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma.

11 Ya mere ebe ayi matara egwu Onye-nwe-ayi, ayi nēme ka madu kweye, ma emewo ka ayi puta ìhè nye Chineke; anamatukwasi kwa obi na emewo ka ayi puta kwa ìhè nime akọ-na-uche-unu.

12 Ayi adighi-eme ọzọ ka unu mara ayi, kama ayi nēkwu dika ndi nēnye unu oghere inya isi n’ihi ayi, ka unu we nwe ihe iza ndi nānya isi n’ihe anāhu anya, ọ bughi kwa n’obi.

13 N’ihi na asi na ayi buru ndi anya nādighi nma, ọ bu n’ebe Chineke nọ; asi kwa na ayi nwere uche zuru okè, ọ bu n’ebe unu nọ.

14 N’ihi na ihu-n’anya Kraist nērugide ayi; ebe ayi nātule nka, na otù Onye nwuru n’ọnọdu madu nile, ya mere madu nile nwuru;

15 Ọ nwu-kwa-ra n’ọnọdu madu nile, ka ndi di ndu we ghara idiri onwe-ha ndu ọzọ, kama ka ha diri Onye ahu ndu, bú Onye nwuru n’ọnọdu ha, eme kwa ka O si n’ọnwu bilie.

16 Ya mere ayi onwe-ayi amataghi onye ọ bula site n’ub͕u a dika anu-aru nāmata: ọbuná asi na ayi amawo Kraist dika anu-aru mara, ma ub͕u a ayi amaghi Ya ọzọ otú a.

17 Ya mere ọ buru na onye ọ bula di nime Kraist, ọ bu onye ekère ọhu: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu.

18 Ma ihe nile sitere na Chineke, Onye sitere n’aka Kraist me ka ayi na Ya onwe-ya di n’otù, O we nye ayi ije-ozi nke ime-ka-adi-n’otú ahu;

19 nke bu na Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n’otù, nāgughi ndahie nile ha megide ha, O debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n’otù ahu.

20 Ya mere ayi bu ndi-ukọ̀ n’ọnọdu Kraist, dika agāsi na Chineke nāriọ aririọ site n’aka-ayi: ayi nọ n’ọnọdu Kraist nāriọ unu, menu ka unu na Chineke di n’otù.

21 Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n’ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 6

1 Ma, dika ndi ayi na Ya nālukọ ọlu, ayi nāriọ kwa unu ka unu ghara inara amara Chineke n’efu,

2 (n’ihi na Ọ nāsi,

N’oge anānara madu nke-ọma ka M’nuru olu-gi,

Ọ bu kwa n’ubọchi nzọputa ka M’yere gi aka:

le, ub͕u a bu oge anānara madu nke-ọma; le, ub͕u a bu ubọchi nzọputa):

3 ayi adighi-eme ihe-isu-ngọngọ ọ bula n’ihe ọ bula, ka aghara ita ije-ozi-ayi uta;

4 kama n’ihe nile ayi nēme ka madu mara ayi, dika ndi nējere Chineke ozi, nime oké ntachi-obi, nime nkpab͕u, nime nkpà, nime oké nkpà,

5 nime ihe-otiti, nime ulo-nkpọrọ, nime aghara, nime idọb͕u onwe-ayi n’ọlu, nime imuru-anya, nime obubu-ọnu;

6 nime idi-ọcha, nime ihe-ọmuma, nime ogologo ntachi-obi, nime obi-ọma, nime Mọ Nsọ, nime ihu-n’anya nke iru-abua nādighi ya,

7 nime okwu nke ezi-okwu, nime ike nke Chineke; site n’ihe-agha nke ezi omume n’aka-nri na aka-ekpe,

8 site n’otuto na ihe-ihere, site na nhota ọjọ na nhota ọma; dika ndi-nduhie, ma ayi bu ndi ezi-okwu;

9 dika ndi anāmaghi aha-ha, ma amazuru ayi; dika ndi nānwu anwu, ma le, ayi di ndu; dika ndi anēme ka ha muta ihe site n’ahuhu, ma adighi-eme ka ayi nwua;

10 dika ndi ihe nēwuta, ma ayi nāṅuri ọṅu mb͕e nile; dika ndi-ob͕eye, ma ayi nēme ka ọtutu madu buru ọgaranya; dika ndi nēnweghi ihe, ma ayi nēnwezu ihe nile.

11 Ndi Kọrint, ọnu-ayi ghere oghe igwawa unu okwu, emewo ka obi-ayi di obodobo.

12 Adighi-eme ka unu nọ n’ọnọdu di oké nkpà nime ayi, ma anēme ka unu nọ n’ọnọdu di oké nkpà n’obi nke unu.

13 Ma dika ugwọ-ọlu n’otù uzọ ahu (anamekwu dika anāgwa umum), ka eme kwa ka unu onwe-unu di obodobo n’obi-unu.

14 Unu na ndi nēkweghi ekwe ekekọtala onwe-unu, n’ihi na unu na ha di iche: n’ihi na òle nkekọ ezi omume na imebi-iwu nēkekọ? ma-ọbu òle nnwekọ ìhè na ọchichiri nēnwekọ?

15 Ọzọ, òle nnwekọ-otù-olu Kraist na Belial nēnwekọ? ma-ọbu òle òkè onye kwere ekwe na onye nēkweghi ekwe nēkerita?

16 Ọzọ, òle nkwekọ ulo nsọ nke Chineke na arusi nēkwekọ? n’ihi na ayi onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu; dika Chineke kwuru, si, M’gēbi nime ha, nējeghari kwa nime ha; M’gābu kwa Chineke nke ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nkem.

17 N’ihi nka

Sinu n’etiti ha puta, guzo-kwa-nu iche,

ka Onye-nwe-ayi kwuru,

Unu emetu-kwa-la ihe nādighi ọcha aka;

Mu onwem gākpọbata kwa unu,

18 Buru kwa unu Nna,

Unu onwe-unu gābu-kwa-ram umu-ndikom na umu-ndinyom,

ka Onye-nwe-ayi kwuru, Nke puru ime ihe nile.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 7

1 Ya mere ndi m’huru n’anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n’onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n’egwu Chineke.

2 Nyenu ayi uzọ n’obi-unu; ayi emeghi onye ọ bula ajọ omume, ayi emebighi onye ọ bula, ayi erib͕ughi onye ọ bula.

3 Ọ bughi ima unu ikpé ka m’nēkwu ya: n’ihi na ekwuwom ya na mbu, na unu di ayi n’obi inwukọ ọnwu na idikọ ndu.

4 Nkwuwa-okwum di uku, bú nke m’ji agwa unu okwu, inya-isim n’ihi unu di uku: nkasi-obi ezuwo ezu nimem, anamaṅuribiga ókè kari na nkpab͕u-ayi nile.

5 N’ihi na mb͕e ayi bia-kwa-ra na Masedọnia, anu-aru-ayi adighi nfé ma-ọli, kama anākpab͕u ayi n’akuku nile; ilu-ọ̀gù di n’èzí, egwu di nime.

6 Otú ọ di, Onye ahu Nke nākasi ndi di ala obi, bú Chineke, were ọbibia Taitọs kasi ayi obi;

7 ọ bighi kwa nání ọbibia-ya, kama O were kwa nkasi-obi nke ejiri kasi ya obi n’aru unu we kasi ayi obi, mb͕e ọ nākọrọ ayi ọgugu m’gusiri unu ike, iru-újú-unu, ekworo unu kworom; ya mere m’ṅuriri ọṅu kari.

8 N’ihi na asi na ọ bu ezie na ejim akwukwọ-ozim me ka o wuta unu, akwaghm uta, asi na ọ bu ezie na anamakwari uta; n’ihi na anamahu na akwukwọ-ozi ahu mere ka o wuta unu, ma asi na ọ bu ezie na ọ bu nání otù oge hour ka o wutara unu.

9 Ub͕u a anamaṅuri ọṅu, ọ bughi na emere ka ihe wuta unu, kama na emere ka o wuta unu rue nchèghari: n’ihi na emere ka o wuta unu dika Chineke chọrọ, ka unu we ghara isite n’ayi yi iyì n’ihe ọ bula.

10 N’ihi na nwuta dika Chineke chọrọ nālu ọlu nchèghari rue nzọputa, bú nchèghari nke anāpughi ikwa uta bayere ya: ma nwuta nke uwa nāluputa ọnwu.

11 N’ihi na le, otù ihe a, na emere ka ihe wuta unu dika Chineke chọrọ, le ka ọ ra, bú inu-ọku-n’obi ọ luputara nime unu, e, le ka ngọpu ra, e, le ka iwe uku ra, e, le ka egwu ra, e, le ka ọgugu m’gusiri unu ike ra, e, le ka ekworo ra, e, le ka nkpeputa ra! N’ihe nile ọ bula unu mere ka amara unu na unu di ọcha n’okwu ahu.

12 Ya mere asi na ọ bu ezie na edegaram unu akwukwọ, ọ bughi n’ihi onye ahu mere ajọ omume ka m’dere ya, ọ bughi kwa n’ihi onye ahu emere ajọ omume megide ya, kama ka ewe me ka inu-ọku-n’obi unu nānu n’ihi ayi putara unu ìhè n’iru Chineke.

13 N’ihi nka akasiwo ayi obi: ma na nkasi-obi-ayi ayi ṅuribigara ókè nke-uku kari n’ihi ọṅù Taitọs, n’ihi na emewo ka mọ-ya zuru ike site n’ebe unu nile nọ.

14 N’ihi na asi na ọ di ihe m’nyaworo ya isi bayere unu, emeghi ka ihere mem; kama dika ayi gwara unu ihe nile n’ezi-okwu, otú a ka esi hu kwa na inya-isi-ayi, nke m’nyara n’iru Taitọs, bu ezi-okwu.

15 Obi-ya dibigara ókè n’ebe unu nọ, mb͕e ọ nēcheta iṅa-nti nke unu nile, otú unu were egwu na ima-jijiji nara ya nke-ọma.

16 Anamaṅuri ọṅu na enwerem obi-ike n’ihe nile n’aru unu.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 8

1 Ọzọ, umu-nnam, ayi nēme ka unu mara amara Chineke nke enyeworo nime nzukọ Kraist nile nke Masedọnia;

2 na nime ọtutu nnwaputa nke nkpab͕u, nbabiga-ókè nke ọṅù-ha na ob͕eye-ọnu-ntu ha bu babigara ókè rue àkù nke afọ-ofufo-ha.

3 N’ihi na ka ike-ha ra, dika m’nāb͕a àmà, e, kari kwa ike-ha, ka ha nyere dika ha zuputara n’onwe-ha,

4 ha were ọtutu aririọ nāriọ ayi ka ayi nye ha amara nka na nnwekọ ije-ozi anējere ndi nsọ:

5 ha me-kwa-ra nka, ọ bughi dika ayi lere anya, kama ha buru uzọ were onwe-ha nye Onye-nwe-ayi, nye kwa ayi site n’ọchichọ Chineke.

6 Ya mere ayi riọrọ Taitọs, ka, dika ọ malitereri na mbu, ka ọ luzu kwa n’etiti unu amara nka otú a kwa.

7 Ma dika unu babigara ókè n’ihe nile, bú okwukwe, na okwu, na ihe-ọmuma, na inu-ọku-n’obi nile, na ihu-n’anya unu huru ayi, lezienu anya ka unu babiga kwa ókè n’amara nka.

8 Ekwughm n’uzọ inye iwu, kama n’iwere inu-ọku-n’obi nke ndi ọzọ nwaputa kwa ihu-n’anya-unu na ọ bu ezi ihu-n’anya.

9 N’ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n’ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya.

10 Na nka ka m’nēnye kwa ìzùm: n’ihi na nka nābara unu urù, madu ndi buru uzọ malite n’arọ gara aga, ọ bughi nání ime eme, kama ichọ kwa achọ.

11 Ma ub͕u a mezu-kwa-nu omume ahu; ka, dika obi di ọku ichọ achọ diri unu, ka ewe site n’ihe unu nwere mezu kwa ya otú a.

12 N’ihi na asi na obi di ọku di ya, ọ bu ihe agānara nke-ọma dika ihe ọ bula madu nwere si di, ọ bughi dika ihe ọ nēnweghi.

13 N’ihi na ekwughm nka, ka o we di ndi ọzọ nfé, ka nkpab͕u we di-kwa-ra unu:

14 kama anamekwu n’uzọ nrata; ebe ihe unu nwebigara ókè mejuru ihe fọduru ha inwe n’oge di ub͕u a, ka ihe ndi ahu nwebigara ókè we meju kwa ihe fọduru unu inwe; ka nrata we di:

15 dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si, Onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya; onye chikọta-kwa-ra ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe.

16 Ma ekele diri Chineke, Onye nētiye otù inu-ọku ahu n’ihi unu n’obi Taitọs.

17 N’ihi na ọ nara aririọ-ayi nke-ọma n’ezie; ma ebe ọ nānu ọku n’obi kari ihe m’chère, o siri n’ebe a pua jekuru unu dika o zuputara n’onwe-ya.

18 Ayi ezìkọwo kwa ya na nwa-nna-ayi ahu onye otuto-ya n’ozi ọma ayi ruzuru nzukọ Kraist nile;

19 ma ọ bughi nání otú a, kama nzukọ Kraist nile rọputa-kwa-ra ya ka ọ nēso ayi n’ije ije n’amara nka, nke ayi nēje ozi ya inye Onye-nwe-ayi otuto, na igosi obi di ọku nke ayi:

20 ma ayi nēze nka, ka onye ọ bula ghara ita ayi uta n’oké onyinye-amara nka nke ayi nēje ozi ya:

21 n’ihi na ayi buru uzọ nēchè ihe ọma, ọ bughi nání n’iru Onye-nwe-ayi, kama n’iru madu kwa.

22 Ayi ezìkọwo kwa ha na nwa-nna-ayi, onye ayi nwaputara ọtutu mb͕e na ọ nānu ọku n’obi n’ọtutu ihe, ma ub͕u a ọ nānu kari ọku n’obi nke-uku, site n’oké ntukwasi-obi nke ọ nātukwasi n’aru unu.

23 Ma ọ buru na onye ọ bula aju ajuju bayere Taitọs, ọ bu onye mu na ya nēnwekọ ihe, buru kwa onye mu na ya nālukọrọ unu ọlu; ma-ọbu umu-nna-ayi, ha bu ndi-ozi nke nzukọ Kraist, ha bu otuto nke Kraist.

24 Ya mere nēgosinu ha n’iru nzukọ Kraist nile ihe gēgosi ihu-n’anya-unu na inya-isi-ayi bayere unu.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 9

1 N’ihi na ọ dighi nkpà ka m’degara unu akwukwọ bayere ijere ndi nsọ ozi:

2 n’ihi na amataram obi di ọku unu, nke m’nānyara ndi Masedọnia isi bayere unu, na Akaia akwadebewo n’arọ gara aga; inu-ọku-unu kwali-kwa-ra obi ndi ka n’ọnu-ọgugu nime ha.

3 Ma ezitewom umu-nna-ayi, ka ewe ghara ime inya-isi ayi nānya bayere unu ka ọ buru ihe-efu n’akuku a; ka unu we buru ndi nọ na nkwadebe, dika m’nēkwuri:

4 ka ewe ghara ime ka ihere me ayi onwe-ayi n’uzọ ọ bula (ka ayi ghara isi, unu onwe-unu) n’ihe a nke ayi dabere, ma asi na ndi Masedọnia gēsom bia, we hu na unu akākwadebeghi.

5 Ya mere agurughi m na ọ di nkpà iriọ umu-nna-ayi, ka ha buru uzọ jekuru unu, buru kwa uzọ me ka ihe-ngọzi ahu nke unu buru uzọ kwe na nkwa zu okè, ka ihe ahu we buru ihe edoziri, dika ihe-ngọzi, ọ bughi kwa dika ihe-nrib͕u.

6 Ma nka ka m’kwuru, Onye were aka-ntagide nāgha nkpuru gēwere kwa aka-ntagide nēwe ihe-ubi; onye were kwa ngọzi nāgha nkpuru gēwere kwa ngọzi nēwe ihe-ubi.

7 Ka onye ọ bula n’etiti unu nye dika o buru uzọ rọputa n’obi-ya; ọ bughi site na nwuta, ma-ọbu site na nkpà: n’ihi na Chineke huru onye were obi-utọ nēnye n’anya.

8 Ma Chineke puru ime ka amara nile babigara unu ókè; ka unu we babiga ókè ilu ezi ọlu nile ọ bula, ebe unu nwezuru ihe nile nākpa unu n’uzọ ọ bula mb͕e nile:

9 dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si,

Ọ ghasara àkù-ya, o nyere ndi-ob͕eye ihe;

Ezi omume-ya nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi.

10 Ma Onye ahu Nke nwere inyezu onye nāgha nkpuru nkpuru-ya, Onye nwe-kwa-ra inyezu madu nri ka o rie, Onye ahu gēnyezu unu nkpuru-ọghigha-unu, me kwa ka ha ba uba, Ọ gēme kwa ka nkpuru ezi omume-unu rie nne kari:

11 ebe anēme ka unu buru ọgaranya n’ihe nile ọ bula rue afọ-ofufo nile, nke sitere n’aka-ayi nāluputa ekele anēkele Chineke.

12 N’ihi na ije-ozi nke ifè-òfùfè a abughi nání ihe nēmezu ihe fọduru ndi nsọ inwe, kama o site-kwa-ra n’ọtutu ekele anēkele Chineke we babiga ókè;

13 ebe ha ji nnwaputa nke ije-ozi a nēnye Chineke otuto n’ihi na edoro nkwuputa-unu n’okpuru ozi ọma Kraist, ya na n’ihi afọ-ofufo nke nnwekọ unu nēme ka ha na madu nile so unu nēnwekọ;

14 ha onwe-ha kwa, n’aririọ-ha n’ihi unu, nāgusi unu ike n’ihi amara Chineke di nime unu nke kariri nke-uku.

15 Ekele diri Chineke n’ihi onyinye-Ya nke anāpughi ikọ akukọ ya.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 10

1 Ma mu onwem Pọl ji idi-nwayọ na obi-ọma nke Kraist nāriọ unu, mu onye nādi ala n’iru unu mb͕e m’nọ n’etiti unu, ma mb͕e m’nānọghi enwem obi-ike n’ebe unu nọ:

2 ma ariọm unu, ka m’ghara inwe obi-ike mb͕e m’nọ n’etiti unu na ntukwasi-obi ahu nke m’nāgu na m’gēji nwe anya-ike imegide ufọdu, ndi nāgu ayi dika ndi nējeghari dika anu-aru-ayi si chọ.

3 N’ihi na ọ bu ezie na ayi nējeghari n’anu-aru, ma ayi adighi-ebu agha dika anu-aru si ebu:

4 (n’ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abughi nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike);

5 ebe ayi nēweda ihe anātule n’obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n’agha iṅa nti Kraist;

6 ayi nānọ kwa dika ndi edoziworo ikpeputa aṅaghi-nti nile n’ìhè, mb͕e ọ bula agēmezu iṅa-nti-unu.

7 Unu nēle ihe di n’iru unu anya. Ọ buru na onye ọ bula atukwasiwo obi n’onwe-ya na ya bu onye Kraist, ya gua nka ọzọ n’onwe-ya, na, dika ya onwe-ya bu onye Kraist, otú a ka ayi onwe-ayi bu kwa.

8 N’ihi na asi na ọ bu ezie na m’gānyabiga isi ókè kari bayere ike-ayi (nke Onye-nwe-ayi nyere iwuli unu elu dika ulo, ọ bughi kwa iweda unu), agaghi-eme ka ihere mem:

9 ka m’we ghara idi unu ka agāsi na ejim akwukwọ-ozim nile me ka unu tua oké egwu.

10 N’ihi na ha nāsi, Akwukwọ-ozi-ya di arọ́ di kwa ike; ma ọnunọ nke aru-ya n’etiti ayi adighi ike, okwu-ya bu kwa ihe akpọrọ ihe-efu.

11 Ka madu di otú a gua nka, na aha madu ayi ji akwukwọ-ozi buru n’okwu mb͕e ayi nānọghi n’etiti unu, madu di otú a ka ayi bu kwa n’ọlu mb͕e ayi nọ n’etiti unu.

12 N’ihi na ayi enweghi anya-ike igu onwe-ayi n’etiti ufọdu, ma-ọbu iwere onwe-ayi tule ha, bú ufọdu ndi ahu ndi ha onwe-ha nēme ka amara ha: ma ebe ha nēwere onwe-ha tù onwe-ha, were kwa onwe-ha tule onwe-ha, ha onwe-ha aghọtaghi ihe.

13 Ma ayi onwe-ayi agaghi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, kama dika ọtùtù nke ihe-ọtùtù ahu si di, bú nke Chineke keputara ayi, dika ọtùtù, ibiaru ọbuná n’ebe unu nọ.

14 N’ihi na ayi esetibigaghi onwe-ayi ókè, dika agāsi na ayi adighi-eru unu: n’ihi na ayi bu ndi buru uzọ biakute unu nime ozi ọma Kraist:

15 ayi adighi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, nke ahu bu, na ndọb͕u ndi ọzọ dọb͕uru onwe-ha n’ọlu; ma ayi nēle anya na, mb͕e okwukwe-unu nāba uba kari, agēme ka ayi di uku n’etiti unu dika ihe-ọtùtù-ayi si di rue ibabiga-ókè,

16 ka ayi we zisa ozi ọma rue ebe nile di n’ofè unu, ghara kwa inya isi bayere ihe edoziri ayi n’ihe-ọtùtù onye ọzọ.

17 Ma onye nānya isi, ya nya n’Onye-nwe-ayi.

18 N’ihi na onye ya onwe-ya nēme ka amara ya, ọ bughi onye ahu ka anwaputaworo, kama ọ bu onye Onye-nwe-ayi nēme ka amara ya.