Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 21

1 Manase b͕ara arọ iri na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hefzi-ba.

2 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n’iru umu Israel.

3 Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya mere ka ha la n’iyì, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Beal, me kwa Ashera, dika Ehab, bú eze Israel, mere, ọ kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.

4 O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche n’ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka M’gētiye aham.

5 O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n’ogige abua nke ulo Jehova.

6 O me-kwa-ra ka nwa-ya mwoke gabiga nime ọku, o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, meso kwa onye nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.

7 Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke Ashera, bú nke o mere, n’ulo ahu nke Jehova siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, N’ulo a, na nime Jerusalem, nke M’rọputaworo n’ebo nile nke Israel, ka M’gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:

8 M’gaghi-eme kwa ka ukwu Israel si n’ala nke M’nyere ndi bu nna-ha waghari ọzọ; nání ọ buru na ha elezi anya ime dika ihe nile si di nke M’nyeworo ha n’iwu, na dika iwu nile si di nke orùm, bú Moses, nyēre ha n’iwu.

9 Ma ha anugh: Manase we me ka ha sihie uzọ ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n’iru umu Israel.

10 Jehova we kwue site n’aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma, si,

11 N’ihi na Manase, bú eze Juda, emewo ihe-árú ndia, we me ihe ọjọ kari ihe nile nke ndi-Amorait mere, ndi buru ya uzọ, o we were arusi-ya nile me ka Juda mehie kwa:

12 n’ihi ya otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M’nēme ka ihe ọjọ biakwasi Jerusalem na Juda, nke nti abua nke onye ọ bula nānu gāzu wuruwuru.

13 M’gēseti kwa n’elu Jerusalem eriri Sameria na ihe-ọtùtù ulo Ehab: M’gēhicha kwa Jerusalem dika madu si ehicha ọkwa, nēhicha ya, nēkpùta ya iru.

14 M’gārapu kwa ndi fọduru nke ihe-nketam, nye ha n’aka ndi-iro-ha; ha gāghọ-kwa-ra ndi-iro-ha nile ihe-nluta-n’agha na ihe ha nānara n’ike;

15 n’ihi na ha emewo ihe jọrọ njọ n’anyam, ha nākpasukwam ìwe, site n’ubọchi ndi bu nna-ha siri n’Ijipt puta, we rue ta.

16 Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n’otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.

17 Ma okwu Manase nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na nmehie-ya nke o mehiere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

18 Manase we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’ubi ulo-ya ab͕ara ogige, n’ubi Uza ab͕ara ogige: Emon nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

19 Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e o malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Meshulemet nwa Haruz nke Jọtba.

20 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere.

21 O we je ije n’uzọ nile nke nna-ya jere, o we fè arusi òfùfè nke nna-ya fère, ọ kpọ isi ala nye ha:

22 o we rapu Jehova, bú Chineke nna-ya-hà, ọ jeghi kwa ije n’uzọ Jehova.

23 Ndi-orù Emon we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka eze nwua n’ulo-ya.

24 Ndi ala ahu we tib͕ue ndi nile nēkekọta onwe-ha imegide eze, bú Emon; ndi ala ahu we me Josaia nwa-ya eze n’ọnọdu ya.

25 Ma ihe nile nke Emon mere nke fọduru, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

26 Ewe lìe ya n’ílì-ya n’ubi Uza ab͕ara ogige: Josaia nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 22

1 Josaia b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jedida nwa Adaia nke Bọkzat.

2 O me ihe ziri ezi n’anya Jehova, je ije n’uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe.

3 O rue, n’arọ nke-iri-na-asatọ nke eze Josaia, na eze zigara Shefan nwa Azalaia, nwa Meshulam, bú ode-akwukwọ, n’ulo Jehova, si,

4 Rigokuru Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, ka o we guzù ego ahu nke anēwebata n’ulo Jehova, nke ndi nēche nbata-uzọ chikọtaworo n’aka ndi Israel:

5 ka ha nye kwa ya n’aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ihe n’ulo Jehova: ka ha nye kwa ya n’aka ndi nēje ozi nke di n’ulo Jehova, iji me ka ebe etipúru etipú di ike;

6 ka ha nye ya n’aka ndi-ọ̀kà n’osisi, na n’aka ndi nēwu ulo, na n’aka ndi nēdo nkume; na iji zuta osisi na nkume awara awa ime ka ulo ahu di ike.

7 Nání na ha na ndi ahu agughi ego nke anēnye n’aka-ha; n’ihi na ọ bu n’ikwesi-ntukwasi-obi ka ndi ahu nēme ihe.

8 Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, we si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n’ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu, ọ gua ya.

9 Shefan, bú ode-akwukwọ, we biakute eze, weghachiri eze okwu, si, Ndi-orù-gi awupuwo ego ahu nke anāchọta n’ulo ahu, ha we nye ya n’aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ulo Jehova.

10 Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n’iru eze.

11 O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke akwukwọ iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile.

12 Eze we nye Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam nwa Shefan, na Akboa nwa Maikaia, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si,

13 Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi nkem, ju-kwa-ra Juda nile, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n’ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke amuyeworo dika ọku megide ayi, n’ihi na nna-ayi-hà egeghi okwu nile nke akwukwọ a nti, ime dika ihe si di nke edeworo n’ihi ayi.

14 Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam, na Akboa, na Shefan, na Asaia, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tikva, nwa Hahas, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n’obodo nke-abua;) ha we gwa ya okwu.

15 Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Sinu nwoke ahu nke ziri unu biakutem,

16 Otú a ka Jehova siri, Le, M’nēme ka ihe ọjọ biarue ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú okwu nile nke akwukwọ ahu nke eze Juda guworo:

17 n’ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe muye ọnumam dika ọku megide ebe a, agaghi-emenyu kwa ya.

18 Ma eze Juda, onye nēzite unu iju Jehova ase, otú a ka unu gāsi ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Okwu ndia nke i nuworo,

19 n’ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n’iru Jehova, mb͕e i nuru ihe M’kwuru megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, na ha gāghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu na ihe-nkọcha, i we dọwa uwe-gi nile, kwa ákwá n’irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

20 N’ihi ya, le, M’gāchikọta gi na nna-gi-hà n’ala-mọ agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n’ílì-gi n’udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a. Ha we weghachiri eze okwu.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 23

1 Eze we ziga, ha we chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem n’ebe ọ nọ.

2 Eze we rigorue ulo Jehova, ya na ndikom nile nke Juda, na ndi nile ndi bi na Jerusalem, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi Juda nile, site n’onye ntà we rue onye uku: o we gua na nti-ha okwu nile nke akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu nke achọtaworo n’ulo Jehova.

3 Eze we guzo n’akuku ogidi, b͕a ndu n’iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n’iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n’akwukwọ a guzosie ike: ndi Juda nile we guzo n’ọb͕ub͕a-ndu ahu.

4 Eze we nye Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nke usoro nke-abua, na ndi nēche nbata-uzọ, iwu, isi n’ulo Jehova weputa ihe nile nke emeworo nye Beal, nye kwa Ashera, nye kwa usu nile nke ihe elu-igwe: o we sure ha ọku n’azu Jerusalem n’ọhia Kidron, būru ntu-ha je Bet-el.

5 O me-kwa-ra ndi-nchu-àjà arusi kwusi, bú ndi-eze Juda doro isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe nile di elu n’obodo Juda nile, na n’ebe di Jerusalem buruburu; o me-kwa-ra ka ndi ahu kwusi, bú ndi nēsurere Beal, na anyanwu, na ọnwa, na kpakpando nējeghari ejeghari, na usu nile nke ihe elu-igwe, ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

6 O si-kwa-ra n’ulo Jehova buputa Ashera je n’azu Jerusalem, rue miri-iyi Kidron, sure ya ọku n’akuku miri-iyi Kidron, supia ya me ka ọ di ka uzuzu, kpofue uzuzu-ya n’elu ílì ndi efu.

7 Ọ kwatu-kwa-ra ulo nile nke ndi edoro nsọ ikwa iko, nke di n’ulo Jehova, ebe ndinyom nākpara Ashera ulo-ikwū.

8 O me-kwa-ra ka ndi-nchu-àjà nile si n’obodo Juda nile bia, o meru-kwa-ra ebe nile di elu ebe ndi-nchu-àjà surere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, site na Geba rue Bia-sheba; ọ kwatu-kwa-ra ebe nile di elu nke ọnu-uzọ-ama nke di n’oghere ọnu-uzọ-ama Joshua, bú onye-isi obodo, nke di n’aka-ekpe madu n’ọnu-uzọ-ama obodo.

9 Nání na ndi-nchu-àjà nke ebe nile di elu adighi-arigo n’ebe-ichu-àjà Jehova nime Jerusalem, ma ha nēri achicha ekoghi-eko n’etiti umu-nne-ha.

10 O meru-kwa-ra Tofet, nke di na ndagwurugwu umu Hinom, ka nwoke ọ bula we ghara ime ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku rue Molek.

11 O me-kwa-ra ka inyinya nile kwusi, bú nke ndi-eze Juda nyere anyanwu, nime nbata ulo Jehova, n’akuku ime-ulo Netan-melek, bú onozi, nke di n’èzí ulo ahu; o sure-kwa-ra ub͕ọ-ala nile nke anyanwu n’ọku.

12 Ebe-ichu-àjà nile nke di n’elu ime-ulo-elu nke Ehaz, nke ndi-eze Juda mere, na ebe-ichu-àjà nile nke Manase mere n’ogige abua nke ulo Jehova, eze kwaturu ha, we si n’ebe ahu b͕a ọsọ, kpofue uzuzu-ha nime miri-iyi Kidron.

13 Ebe nile di elu nke di n’iru Jerusalem, nke di n’aka-nri ugwu nbibi, nke Solomon, bú eze Israel, wuru nye Ashtoret, bú ihe-árú ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú ihe-árú Moab, nye kwa Milkom, bú ihe-árú umu Amon, eze meru-kwa-ra ha.

14 O tipia-kwa-ra ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, were ọkpukpu madu mejue ọnọdu-ha.

15 Ọzọ kwa, ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, na ebe di elu nke Jeroboam nwa Nebat mere, bú onye mere ka Israel mehie, ọbuná ebe-ichu-àjà ahu na ebe ahu di elu ka ọ kwaturu; o sure ebe ahu di elu ọku, supia ya me ka ọ ghọ uzuzu, sure kwa Ashera ọku.

16 Josaia we chigharia onwe-ya, hu ílì nile nke di n’ebe ahu n’ugwu ahu; o we zìe, chipu ọkpukpu n’ílì nile, sure ha ọku n’elu ebe-ichu-àjà ahu, merua ya, dika okwu Jehova si di nke onye nke Chineke ahu kpọsara, bú onye kpọsara ihe ndia.

17 O we si, Gini bu ihe-iriba-ama ahu nke mu onwem nāhu? Ndikom obodo ahu we si ya, Ọ bu ílì onye nke Chineke, onye siri na Juda bia, kpọsa ihe ndia nke i meworo megide ebe-ichu-àjà Bet-el.

18 Ọ si, Ya nọduru onwe-ya; ka nwoke ọ bula ghara ichipu ọkpukpu-ya. Ha we rapu ọkpukpu-ya, ha na ọkpukpu onye-amuma ahu nke siri na Sameria bia.

19 Ọzọ kwa, ulo nile nke ebe nile di elu, nke di n’obodo nile nke Sameria, nke ndi-eze Israel mere ikpasu Jehova iwe, ha ka Josaia wezugara, me kwa ha dika omume nile si di nke o mere na Bet-el.

20 O b͕ue ndi-nchu-àjà nile nke ebe nile di elu nke di n’ebe ahu, n’elu ebe-ichu-àjà nile, o sure-kwa-ra ọkpukpu madu n’elu ha; o we laghachi na Jerusalem.

21 Eze we nye ndi Juda nile iwu, si, Merenu Jehova, bú Chineke-unu, ememe ngabiga, dika edeworo ya n’akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu nka.

22 N’ezie emeghi ememe ngabiga dika ememe ngabiga nka site n’ubọchi ndi-ikpe ndi kpere Israel, ọbuná ubọchi nile nke ndi-eze Israel, na nke ndi-eze Juda;

23 ma ọ bu n’arọ nke-iri-na-asatọ nke eze, bú Josaia, ka emere ememe ngabiga nka nye Jehova nime Jerusalem.

24 Ọzọ kwa, ndi nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa, na teraphim, na arusi nile, na ihe-árú nile nke ahuru n’ala Juda, na nime Jerusalem, ndia ka Josaia tkpochapuru, ka o we me ka okwu nile nke iwu guzosie ike, bú nke edeworo n’akwukwọ nke Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara n’ulo Jehova.

25 Ọ dighi eze nke buru ya uzọ di ka ya, onye were obi-ya nile, were kwa nkpuru-obi-ya nile, were kwa ike-ya nile, chigharikute Jehova, dika iwu nke Moses si di; ọ dighi kwa onye ọzọ dika ya biliri mb͕e ọ nwusiri.

26 Otú ọ di, Jehova esighi n’idi-ọku iwe uku Ya laghachi, nke iwe-Ya ji di ọku megide Juda, n’ihi nkpasu-iwe nile nke Manase kpasuru Ya.

27 Jehova we si, M’gēsi kwa n’irum wezuga Juda, dika M’wezugara Israel, M’gāju kwa obodo a nke M’rọputaworo, bú Jerusalem, na ulo ahu nke M’siri, Aham gādi n’ebe ahu.

28 Ma okwu Josaia nile nke fọduru, na ihe nile nke o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

29 N’ubọchi-ya ka Fero-neko, bú eze Ijipt, rigoro imegide eze Asiria rue osimiri Yufretis: eze, bú Josaia, we je izute ya; o we me ka ọ nwua na Megido, mb͕e ọ huru ya.

30 Ndi-orù-ya we si na Megido buru ya nime ub͕ọ-ala mb͕e ọ nwuru anwu, ha we bubata ya na Jerusalem, lìe ya n’ílì-ya. Ndi ala ahu we kuru Jehoahaz nwa Josaia, te ya manu, me ya eze n’ọnọdu nna-ya.

31 Jehoahaz b͕ara orú arọ na atọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọnwa atọ nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna.

32 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya-hà mere.

33 Fero-neko we ke ya ab͕u nime Ribla n’ala Hemat, ka o we ghara ibu eze nime Jerusalem; o we tukwasi ala ahu nra, bú ọgu talent ọla-ọcha ise, na otù talent ọla-edo.

34 Fero-neko we me Elaiakim nwa Josaia eze n’ọnọdu Josaia nna-ya, gugharia ya aha Jehoiakim: ma o wepuru Jehoahaz; ọ biarue Ijipt, nwua n’ebe ahu.

35 Jehoiakim we nye Fero ọla-ọcha na ọla-edo ahu; nání na ọ ruru ala ọnu inye ego n’okwu-ọnu Fero: o were ihe-ike nara ndi ala ahu ọla-ọcha na ọla-edo, nwoke ọ bula dika ọ̀rùrù-ọnu-ya si di, inye ya Fero-neko.

36 Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Zebida nwa Pedaia nke Ruma.

37 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya-hà mere.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 24

1 N’ubọchi-ya Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoro, Jehoiakim we ghọrọ ya orù arọ atọ: o we chigharia nupu isi n’okpuru ya.

2 Jehova we zìe usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Kaldea, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Moab, na usu ndi nāpunara madu ihe nke umu Amon, imegide ya, o zì-kwa-ra ha imegide Juda ime ka ọ la n’iyì, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru site n’aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma.

3 N’ezie n’okwu-ọnu Jehova ka ihe a di n’aru Juda, isi n’iru Ya wezuga ha, n’ihi nmehie nile nke Manase, dika ihe nile si di nke o mere;

4 ọzọ kwa, n’ihi ọbara nēmeghi ihe ọjọ nke ọ wusiri; o we mejue Jerusalem n’ọbara nēmeghi ihe ọjọ: Jehova ekweghi kwa ib͕aghara.

5 Ma okwu Jehoiakim nile fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

6 Jehoiakim we so nna-ya-hà dina n’ọnwu: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

7 Ma eze Ijipt esighi n’ala-ya puta ọzọ ma-ọli: n’ihi na eze Babilon ewerewo ihe nile eze Ijipt nwere site na miri-iyi Ijipt rue osimiri Yufretis.

8 Jehoiakin b͕ara arọ iri na asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze nime Jerusalem ọnwa atọ: aha nne-ya bu Nehushta nwa Elnetan nke Jerusalem.

9 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.

10 Na mb͕e ahu ka ndi-orù Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoruru Jerusalem, ewe nọchigide obodo ahu n’agha.

11 Nebukadneza, bú eze Babilon, we biarue obodo ahu, mb͕e ndi-orù-ya nānọchigide ya n’agha;

12 Jehoiakin, bú eze Juda, we pukuru eze Babilon, ya onwe-ya, na nne-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-onozi-ya: eze Babilon we jide ya n’arọ nke-asatọ nke ọ bu eze.

13 O si n’ebe ahu chipu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe ọla-edo nile nke Solomon, bú eze Israel, mere n’ulo uku Jehova, dika Jehova siri.

14 O me-kwa-ra ka Jerusalem nile, na ndi-isi nile, na ndi-dike nile bu dìnkpà, je biri n’ala ọzọ, bú orú nnù ise ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ha na onyeọ̀kà ọ bula na uzú ọ bula; ọ dighi onye fọduru, ọ bu nání ndi nēnweghi ike nime ndi ala ahu.

15 O me-kwa-ra ka Jehoiakin je biri na Babilon; nne eze, na ndinyom eze, na ndi-onozi-ya, na ndi-dike nke ala ahu, ndia ka ọ mere ka ha si na Jerusalem je na Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ.

16 Ndikom nile kwa ndi bu dìnkpà, nnù iri-na-asa na ọgu iri, na ndi-ọ̀kà na ndi-uzú, nnù abua na ọgu iri, ha nile bu ndi-dike, ndi nēbu agha, eze Babilon we me ka ha bia Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ.

17 Eze Babilon we me Matanaia nwa-nne nna-ya eze n’ọnọdu ya, gughari kwa ya aha Zedekaia.

18 Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna.

19 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke Jehoaiakim mere.

20 N’ihi na ọ bu n’ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na nime Juda, rue mb͕e O siri n’iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n’okpuru eze Babilon.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 25

1 O rue, n’arọ nke-iteghete nke ọ bu eze, n’ọnwa nke-iri, n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na Nebukadneza, bú eze Babilon, biara, ya onwe-ya na usu-ndi-agha-ya nile, imegide Jerusalem, ọ ma ulo-ikwū megide ya; ha we wue ulo-agha imegide ya buruburu.

2 Ewe nānọchigide obodo ahu n’agha rue arọ nke-iri-na-otù nke eze, bú Zedekaia.

3 N’ubọchi nke-iteghete nke ọnwa nke-anọ oké unwu siri ike n’obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.

4 Ewe tipue obodo, ndikom agha nile we b͕apu n’abali n’uzọ ọnu-uzọ-ama n’etiti mb͕idi-ya abua, nke di n’akuku ubi eze ab͕ara ogige: (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) eze we je n’uzọ Araba.

5 Usu-ndi-agha ndi Kaldea we chua eze n’azu, rue ya aru n’ala ihe nādighi nke Jeriko: ma usu-ndi-agha-ya nile siri n’ebe ọ nọ b͕asasia.

6 Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla; ha we kwue okwu ikpé n’ebe ọ nọ.

7 Ha we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n’anya-ya, Nebukadneza me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n’anya-ya abua, ha were kwa ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, ha we me ka ọ ba na Babilon.

8 Ma n’ọnwa nke-ise, n’ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-iri-na-iteghete nke eze, bú Nebukadneza, eze Babilon, ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, orù eze Babilon, biaruru Jerusalem:

9 o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n’ọku.

10 Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu.

11 Ma ndi ala ahu nke fọduru, bú ndi fọduru n’obodo, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n’etiti igwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n’ala ọzọ.

12 Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka onye-isi ndi-ob͕ū mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlụ-ubi.

13 Ma ogidi ọla nile nke di n’ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n’ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha je Babilon.

14 Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.

15 Ihe-igu-ọku nile kwa, na ọkwa-nwusa nile; ihe nke bu ọla-edo, n’ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n’ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.

16 Ogidi abua ahu, otù oké osimiri ahu, na ihe-ndọkwasi nile, nke Solomon mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile.

17 Cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di, isi nke di n’elu ya bu kwa ọla: idi-elu isi ahu di cubit atọ; ihe-ọkpukpa na pomegranate di kwa n’isi ahu buruburu, ha nile bu ọla: ihe dika ndia ka ogidi nke-abua nwe-kwa-ra, ha na ihe-ọkpukpa.

18 Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:

19 o si-kwa-ra n’obodo chiri otù onozi nke emeworo onye-nlekọta ndikom agha: na ndikom ise nime ndi nāhu iru eze, ndi achọtara n’obodo; na ode-akwukwọ, bú onye-isi usu-ndi-agha, onye nēme ka ndi ala ahu zukọta ibu agha; na ọgu ndikom atọ nime ndi ala ahu, ndi achọtaworo n’obodo.

20 Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we chiri ha, me ka ha jekuru eze Babilon rue Ribla.

21 Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n’ala Hemat. Eze we me ka Juda si n’ala-ya je biri n’ala ọzọ.

22 Ma ndi fọduru n’ala Juda, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha fọdu, o we me Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka ọ buru onye-nlekọta-ha.

23 Ndi-isi nile nke usu-ndi-agha nile, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia onye-nlekọta, ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan nwa Karca, na Seraia nwa Tanhumet onye Netofa, na Jaazanaia nwa onye Meakat, ha onwe-ha na ndikom-ha.

24 Gedalaia we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si ha, Unu atula egwu n’ihi ndi-orù ndi Kaldea: birinu n’ala, fè kwa eze Babilon òfùfè, ọ gādi-kwa-ra unu nma.

25 O rue, n’ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, biara, ya na ndikom iri, ha we tib͕ue Gedalaia, o we nwua, ha tib͕u-kwa-ra ndi-Ju na ndi Kaldea ndi ya na ha nọ na Mizpa.

26 Ndi-Ju nile, site n’onye ntà we rue onye uku, na ndi-isi usu-ndi-agha nile, we bilie, biarue Ijipt: n’ihi na ha turu egwu ndi Kaldea.

27 O rue, n’arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n’ala ọzọ, n’ọnwa nke-iri-na-abua, n’ubọchi nke-orú-na-asa nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n’arọ ọ malitere ibu eze, o siri n’ulo-nkpọrọ welie isi Jehoiakin, bú eze Juda;

28 o we gwa ya okwu ọma, do oche-eze-ya elu kari oche-eze nke ndi-eze ndi ya na ha nọ na Babilon.

29 O we b͕anwe uwe nkpọrọ ya, ọ we nēri nri n’iru ya mb͕e nile ubọchi nile nke ndu-ya.

30 Anēnye kwa ya òkè-ihe-oriri-ya, bú òkè-ihe-oriri mb͕e nile, site n’aka eze, ihe nke ubọchi n’ubọchi-ya, ubọchi nile nke ndu-ya.