Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 11

1 Mb͕e Atalaia, bú nne Ehazaia, huru na nwa-ya nwoke anwuwo, o bilie, me ka nkpuru nile ndi nwe ala-eze la n’iyì.

2 Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n’etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n’ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n’iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua.

3 O we nọ n’aka-ya n’ulo Jehova nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu.

4 Ma n’arọ nke-asa Jehoiada zigara chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi diri ndi-Karait, na ndi diri ndi-ọb͕a-ọsọ, o me ka ha bakute ya n’ulo Jehova; ya na ha we b͕a ndu, o me ka ha ṅua iyi n’ulo Jehova, o me kwa ka ha hu nwa eze.

5 O we nye ha iwu, si, Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n’uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n’ubọchi-izu-ike, ganēdebe kwa ihe-ndebe ulo eze;

6 otù uzọ n’uzọ atọ gādi kwa n’ọnu-uzọ-ama Sua; otù uzọ n’uzọ atọ gādi kwa n’ọnu-uzọ-ama n’azu ndi-ọb͕a-ọsọ: unu gēdebe kwa ihe-ndebe nke ulo a, buru ihe-nb͕ochi.

7 Ma usu abua ahu nime unu, bú ndi nile nāpu apu n’ubọchi-izu-ike, ha gēdebe kwa ihe-ndebe ulo Jehova buruburu eze.

8 Unu gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n’aka-ya; ma onye nābata nime akuku-unu, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nāpu n’èzí, na mb͕e ọ nābà nime.

9 Ndi-isi usu ọgu ndikom ise we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n’iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n’ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n’ubọchi-izu-ike, ha we biakute Jehoiada, bú onye-nchu-àjà.

10 Onye-nchu-àjà we nye ndi-isi usu ọgu ndikom ise ube na ọta nke eze, bú Devid, nwereri, nke di n’ulo Jehova.

11 Ndi-ọb͕a-ọsọ we guzo, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n’aka-ya, site n’akuku aka-nri ulo rue akuku aka-ekpe ulo ahu, n’akuku ebe-ichu-àjà na n’akuku ulo, n’akuku eze buruburu.

12 O we me ka nwa eze puta, o kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà; ha we me ya eze, te ya manu, kua aka-ha, si, Ka eze di ndu.

13 Atalaia we nu olu ndi-ọb͕a-ọsọ na nke ndi Juda, o we biakute ndi ahu n’ulo Jehova:

14 ọ hu, ma, le, eze nēguzo n’akuku ogidi, dika ikpé si di, ndi-isi na opì-ha di kwa n’akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, kpọ, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.

15 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise iwu, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n’etiti akuku; ma onye nābiaso ya n’azu, werenu mma-agha me ka ọ nwua: n’ihi na onye-nchu-àjà siri, Ka aghara ime ka ọ nwua n’ulo Jehova.

16 Ha we doro ya onwe-ha n’akuku abua; o we si uzọ nbata inyinya ba n’ulo eze: ewe me ka ọ nwua n’ebe ahu.

17 Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n’etiti Jehova na eze na ndi Juda, na ha gābu ndi Jehova nwere; na n’etiti eze na ndi Juda.

18 Ndi nile nke ala ahu we ba n’ulo Beal, kwatue ya; ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha tupiara ha nke-ọma, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n’iru ebe-ichu-àjà ahu. Onye-nchu-àjà we do ndi-nkekọta ilekọta ulo Jehova.

19 Ọ we chiri ndi-isi usu ọgu ndikom ise, na ndi-Karait, na ndi-ọb͕a-ọsọ, na ndi nile nke ala ahu; ha we me ka eze si n’ulo Jehova rida, ha we si uzọ ọnu-uzọ-ama ndi-ọb͕a-ọsọ ba n’ulo eze. O we nọkwasi n’oche ndi-eze.

20 Ndi nile nke ala ahu we ṅuria ọṅu, obodo ahu di-kwa-ra jū: ha we were mma-agha me ka Atalaia nwua n’ulo eze.

21 Jehoash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 12

1 N’arọ nke-asa nke Jihu ka Jehoash malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba.

2 Jehoash we me ihe ziri ezi n’anya Jehova ubọchi-ya nile nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, zíri ya ihe.

3 Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe di elu nile.

4 Jehoash we si ndi-nchu-àjà, Ego nile nke ihe nsọ nile nke anēwebata n’ulo Jehova, bú ego onye nāgabiga n’ebe ndi agukọtara agukọta nọ, nwoke ọ bula ego madu nile nke ọ̀rùrù-ọnu-ya, na ego nile nke ọ batara n’obi nwoke ọ bula iwebata n’ulo Jehova,

5 ka ndi-nchu-àjà were ya n’onwe-ha, nwoke ọ bula site n’aka onye ọ mara: ha onwe-ha gēme ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike, ebe ọ bula agāchọta ebe etipúru etipú.

6 O rue, n’arọ nke-orú-na-atọ nke eze, bú Jehoash, na ndi-nchu-àjà emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.

7 Eze, bú Jehoash, we kpọ Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa ndi-nchu-àjà ọzọ, si ha, Gini mere unu emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike? ma ub͕u a unu anarala ego n’aka ndi unu mara, kama nyenu ya ime ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.

8 Ndi-nchu-àjà we kwere ka ha ghara inara ego n’aka ndi Juda, ka ha ghara kwa ime ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.

9 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we were otù ib͕e, rapúe oghere n’okwu-ya, dọba ya n’akuku ebe-ichu-àjà, n’aka-nri nke ebe madu nābà n’ulo Jehova: ndi-nchu-àjà ndi nēche nbata-uzọ we tiye n’ebe ahu ego nile anēwebata n’ulo Jehova.

10 O rue, mb͕e ha huru na ego ahu riri nne n’ib͕e ahu, na ode-akwukwọ eze na onye-isi-nchu-àjà rigoro, ke ego ahu n’ihe, gu kwa ya, bú nke achọtara n’ulo Jehova.

11 Ha we nye ego ahu nke atùrù atù n’aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ulo Jehova: ha we weputa ya nye ndi-ọ̀kà n’osisi, nye kwa ndi nēwu ulo, bú ndi nālu ọlu n’ulo Jehova,

12 nye kwa ndi nēdo nkume, nye kwa ndi nāwa nkume, na iji zuta osisi na nkume awara awa ime ka ebe etipúru etipú nke ulo Jehova di ike, na ikwu ugwọ ihe nile nāputara ulo ahu ime ka ọ di ike.

13 Otú ọ di, emeghi iko ọla-ọcha, na ihe-ikpakepu-ọku, na ọkwa-nwusa, na opì, ihe ọla-edo ọ bula, ma-ọbu ihe ọla-ọcha, nye ulo Jehova, site n’ego nke anēwebata n’ulo Jehova:

14 n’ihi na ọ bu ndi nēje ozi ahu ka ha nyere ya, were kwa ya me ka ulo Jehova di ike.

15 Ha na ndikom ahu, ndi ha nēnye ego n’aka-ha inye ndi n’eje ozi ahu, agughi ego ahu: n’ihi na ọ bu n’ikwesi-ntukwasi-obí ka ndi ahu nēme ihe.

16 Adighi-ewebata ego àjà-ikpe-ọmuma na ego àjà-nmehie n’ulo Jehova: ọ bu ndi-nchu-àjà nwe ya.

17 Mb͕e ahu Hazael, bú eze Siria, rigoro, buso Gat agha, were ya: Hazael we che iru-ya imegide Jerusalem.

18 Jehoash, bú eze Juda, we chiri ihe nsọ nile nke Jehoshafat, na Jehoram, na Ehazaia, nna-ya-hà, bú ndi-eze Juda, doro nsọ, na ihe nsọ ya nile, na ọla-edo nile anāchọta n’àkù nile nke ulo Jehova, na nke ulo eze, zigara Hazael, bú eze Siria: o we si na Jerusalem rigo.

19 Ma okwu Joash nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

20 Ndi-orù-ya we bilie, kekọta nkekọta-madu imegide ya, tib͕ue Joash n’ulo Milo, n’uzọ nke nāridaru Sila.

21 N’ihi na Jozaka nwa Shimeat, na Jehozabad nwa Shomea, bú ndi-orù-ya, tib͕uru ya, o we nwua; ha we lìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Devid: Amazaia nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 13

1 N’arọ nke-orú-na-atọ nke Jọash nwa Ehazaia, bú eze Juda, ka Jehoahaz nwa Jihu malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ iri na asa.

2 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, jeso nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie; o sighi nime ya wezuga onwe-ya.

3 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O nye ha n’aka Hazael, bú eze Siria, na n’aka Ben-hedad nwa Hazael, ubọchi nile.

4 Jehoahaz we chọ ime ka iru Jehova dajua, Jehova we ge ya nti: n’ihi na Ọ huru nmeb͕u Israel, n’ihi na eze Siria meb͕uru ha.

5 (Jehova we nye Israel onye-nzọputa, ha we pua n’okpuru aka Siria: umu Israel we biri n’ulo-ikwū-ha, dika na mb͕e gara aga.

6 Otú ọ di, ha esighi na nmehie nile nke ulo Jeroboam wezuga onwe-ha, bú nke o jiri me Israel ka ha mehie, ma Jehoahaz nējeghari nime ya: ọzọ kwa, Ashera guzoro na Sameria.)

7 N’ihi na ọ kweghi ka ndi Israel ọ bula fọduru Jehoahaz, ọ bu nání ọgu ndi-inyinya abua na iri, na ub͕ọ-ala iri, na orú nnù ndikom na nnù ise ndi ji ukwu eje; n’ihi na eze Siria mere ka ha la n’iyì, me kwa ha ka ha di ka ájá izọkwasi ukwu.

8 Ma okwu Jehoahaz nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ nke ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

9 Jehoahaz we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, ha we lìe ya na Sameria: Joash nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

10 N’arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke Joash, bú eze Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ibu eze Israel; nime Sameria arọ iri na isi.

11 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, bú nke o jiri me ka Israel mehie, wezuga onwe-ya: kama o jeghariri nime ya.

12 Ma okwu Joash nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya nke o jiri buso Amazaia, bú eze Juda, agha, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

13 Joash we so nna-ya-hà dina n’ọnwu; Jeroboam we nọkwasi n’oche-eze-ya: ewe lìe Joash nime Sameria n’ebe elìri ndi-eze Israel.

14 Ma Elaisha nāria ọria nke ọria-ya ahu nke ọ nwuru nime ya: Joash, bú eze Israel, we ridakuru ya, kwa ákwá n’iru ya, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya!

15 Elaisha we si ya, Chiri uta na àkú: o we chiri uta na àkú n’aka-ya.

16 Ọ si eze Israel, Tukwasi aka-gi n’uta: o we tukwasi aka-ya. Elaisha we tukwasi aka-ya abua n’aka abua nke eze.

17 Ọ si, Meghe window n’akuku Iru-anyanwu: o we meghe. Elaisha we si, B͕a: o we b͕a. Ọ si, Àkú nzọputa Jehova nwere, bú àkú nzọputa imegide Siria: i gētib͕u kwa Siria n’Efek, rue mb͕e i gēme ka ha gwusia.

18 Ọ si, Chiri àkú: o we chiri ha. Ọ si eze Israel, Tida n’ala: o we tie ub͕ò atọ, guzo.

19 Onye nke Chineke ahu we wesa ya iwe, si, Asi na i tiri ub͕ò ise ma-ọbu ub͕ò isi; mb͕e ahu i gēti Siria rue mb͕e i gēme ka ọ gwusia: ma ub͕u a i gēti Siria nání ub͕ò atọ.

20 Elaisha we nwua, ha we lìe ya. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Moab batara n’ala mb͕e arọ ọhu biara.

21 O rue, mb͕e ha nēli otù nwoke, le, ha huru usu ndi nāpunara madu ihe; ha we tubà nwoke ahu n’ílì Elaisha: nwoke ahu we da, metu ọkpukpu Elaisha aru, we di ndu, bilie guzo n’ukwu-ya abua.

22 Ma Hazael, bú eze Siria, meb͕uru Israel ub͕ochi nile nke Jehoahaz.

23 Jehova we mere ha amara, nwe obi-ebere n’aru ha, che ha iru, n’ihi ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob mere, O kweghi kwa ibibi ha, O sighi kwa n’iru Ya chupu ha rue ub͕u a.

24 Hazael, bú eze Siria, we nwua; Ben-hedad nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

25 Jehoash nwa Jehoahaz we naghachi n’aka Ben-hedad nwa Hazael obodo nile nke ọ nara n’aka Jehoahaz nna-ya n’agha. Ub͕ò atọ ka Joash tib͕uru ya, we weghachi obodo nile nke Israel.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 14

1 N’arọ nke-abua nke Joash nwa Joahaz, bú eze Israel, ka Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, malitere ibu eze.

2 Ọ b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete na Jerusalem: aha nne-ya bu Jehoadin nke Jerusalem.

3 O me ihe ziri ezi n’anya Jehova, nání na o meghi dika Devid nna-ya; dika ihe nile si di nke Joash nna-ya mere, otú a ka o mere.

4 Nání na ewzugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe nile di elu.

5 O rue, mb͕e ala-eze di ike n’aka-ya, na o tib͕uru ndi-orù-ya ndi tib͕uru eze, bú nna-ya:

6 ma o meghi ka umu nke ndi-otib͕u-madu ahu nwua: dika nke edeworo n’akwukwọ iwu Moses si di, nke Jehova nyere n’iwu, si, Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n’ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n’ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya.

7 Ya onwe-ya tib͕uru Edom nime Ndagwurugwu Nnú, orú nnù ndikom na nnù ise, were kwa Sela n’agha, kpọ aha-ya Jokteel, rue ta.

8 Mb͕e ahu Amazaia zigara ndi-ozi jekuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jihu, bú eze Israel, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n’iru.

9 Jehoash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu.

10 I tib͕uwo Edom n’ezie, obi-gi we bulie gi elu: ka asọpuru gi na nka, nọdu kwa n’ulo-gi; ma n’ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n’ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi?

11 Ma Amazaia anughi. Jehoash, bú eze Israel, we rigo; ya onwe-ya na Amazaia, bú eze Juda, we lerita onwe-ha anya n’iru na Bet-shemesh, nke Juda nwere.

12 Ewe tib͕ue Juda n’iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n’ulo-ikwū-ya.

13 Jehoash, bú eze Israel, we jide Amazaia, bú eze Juda, nwa Jehoash nwa Ehazaia, nime Bet-shemesh, we biarue Jerusalem, tipue mb͕idi Jerusalem site n’ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit.

14 Ọ chiri ọla-edo na ọla-ọcha nile, na ihe nile ahutara n’ulo Jehova, na n’àkù nile nke ulo eze, na ndi edoro na mbe, o we laghachi na Sameria.

15 Ma ihe Jehoash nile nke fọduru, nke o mere, na idi-ike-ya, na otú o busoro Amazaia, bú eze Juda, agha èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

16 Jehoash we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya nime Sameria n’ebe elìri ndi-eze Israel; Jeroboam nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

17 Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Jehoash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise.

18 Ma ihe nile nke Amazaia mere nke fọduru, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

19 Ha we kekọta nkekọta-madu megide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n’ebe ahu.

20 Ha we bute ya n’elu inyinya: ewe lìe ya nime Jerusalem n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Devid.

21 Ndi nile nke Juda we were Azaraia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n’ọnọdu nna-ya Amazaia.

22 Ya onwe-ya wuru Ilat, nyeghachi ya Juda, mb͕e eze sorosiri nna-ya-hà dina n’ọnwu.

23 N’aro nke-iri-na-ise nke Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, ka Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, malitere ibu eze na Sameria ọgu arọ abua na otù.

24 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.

25 Onye ahu weghachiri ókè-ala Israel site na nbata Hemat rue oké osimiri Araba, dika okwu Jehova, bú Chineke Israel, si di, nke O kwuru site n’aka Jona nwa Amitai, bú onye-amuma, nke sitere na Gat-hefa.

26 N’ihi na Jehova huru nweda-n’ala nke Israel, na ọ di ilu nke-uku: ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọdu onye arapuru fọduru, ọ dighi kwa onye-iye-aka ọ bula Israel nwere.

27 Ma Jehova ekwughi na Ọ gēhichapu aha Israel n’okpuru elu-igwe: O we si n’aka Jeroboam nwa Joash zọputa ha.

28 Ma okwu Jeroboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, otú o buru agha, otú o weghachi-kwa-ra Damaskọs, na Hemat, nke Juda nwere, nye Israel, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

29 Jeroboam we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, bú ndi-eze Israel; Zekaraia nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 15

1 N’arọ nke-orú-na-asa nke Jeroboam, bú eze Israel, ka Azaraia nwa Amazaia, bú eze Juda, malitere ibu eze.

2 Arọ iri na isi ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; ọ buru eze ọgu arọ abua iri na abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jekolaia nke Jerusalem.

3 O me ihe ziri ezi n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke Amazaia nna-ya mere.

4 Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe di elu nile.

5 Jehova we tie eze ahu ihe, o we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n’ulo ewupuru iche. Ma Jotam nwa eze bu onye-isi ulo-ya, nēkpe ndi ala ahu ikpe.

6 Ma okwu Azaraia nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

7 Azaraia we so nna-ya-ha dina n’ọnwu; ha we lìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Devid: Jotam nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

8 N’arọ nke-orú-na-iri-na-asatọ nke Azaraia, bú eze Juda, ka Zekaraia nwa Jeroboam malitere ibu eze Israel nime Sameria ọnwa isi.

9 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova dika nna-ya-hà mere: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.

10 Shalum nwa Jedesh we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya n’iru ndi Israel, me ka ọ nwua, we buru eze n’ọnọdu ya.

11 Ma ihe Zekaraia mere nke fọduru, le, edewo ha n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel.

12 Nka bu okwu Jehova, nke Ọ gwara Jihu, si, Umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n’oche-eze Israel. O we di otú a.

13 Shalum nwa Jebesh malitere ibu eze n’arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Uzaia, bú eze Juda; o we buru eze ogologo otù ọnwa nime Sameria.

14 Menahem nwa Gadi we si na Tiaza rigo, biarue Sameria, tib͕ue Shalum nwa Jebesh nime Sameria, me ka ọ nwua, we buru eze n’ọnọdu ya.

15 Ma ihe nile Shalum mere nke fọduru, na nkekọta-ya nke ọ kekọtara madu imegide eze, le, edewo ha n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel.

16 Mb͕e ahu Menahem tib͕uru Tifsa na ndi nile nọ nime ya, na ókè-ala-ya nile, site na Tiaza: n’ihi na ha emegheghi ya uzọ, n’ihi ya ka o tib͕uru ya; ndinyom-ya nile ndi di ime, ọ b͕awara ha afọ.

17 N’arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Azaraia, bú eze Juda, ka Menahem nwa Gadi malitere ibu eze Israel arọ iri nime Sameria.

18 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya ubọchi-ya nile, bú nmehie o jiri me ka Israel mehie.

19 Pul, bú eze Asiria, we bia imegide ala ahu; Menahem we nye Pul nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri, ka aka-ya we diyere ya ime ka ala-eze di ike n’aka-ya.

20 Menahem we naputa ego ahu n’aka Israel, bú n’aka ndi-dike n’àkù, inye eze Asiria, ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri diri otù nwoke. Eze Asiria we laghachi, o guzoghi kwa n’ebe ahu n’ala ahu.

21 Ma okwu Menahem nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

22 Menahem we so nna-ya-hà dina n’ọnwu; Pekahaia nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

23 N’arọ nke-ọgu-abua-na-iri nke Azaraia, bú eze Juda, ka Pekahaia nwa Menahem malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ abua.

24 O wee me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.

25 Peka nwa Remalaia, bú onye-isi-agha-ya, we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya nime Sameria, n’ulo-elu nke ulo eze, ya na Agob na Arie; ọgu ndikom abua na iri nke umu ndi Gilead nọye-kwa-ra ya: o we me ka ọ nwua, we buru eze n’ọnọdu ya.

26 Ma okwu Pekahaia nile nke fọduru, na ihe nile o mere, le, edewo ha n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel.

27 N’arọ nke-ọgu-abua-na-iri-na-abua nke Azaraia, bú eze Juda, ka Peka nwa Remalaia malitere ibu eze Israel nime Sameria orú arọ.

28 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.

29 N’ubọchi Peka, bú eze Israel, ka Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, biara, were Ijon, na Ebel-bet-meaka, na Janoa, na Kedesh, na Hezoa, na Gilead, na Galili, bú ala nile nke Naftali; o we me ka ha je biri n’Asiria.

30 Hoshea nwa Ila we kekọta nkekọta-madu megide Peka nwa Remalaia, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, we buru eze n’ọnọdu ya, n’arọ nke-orú nke Jotam nwa Uzaia.

31 Ma okwu Peka nile nke fọduru, na ihe nile o mere, le, edewo ha n’akwukwọ, ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel.

32 N’arọ nke-abua nke Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, ka Jotam nwa Uzaia, bú eze Juda, malitere ibu eze.

33 Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok.

34 O me ihe ziri ezi n’anya Jehova: dika ihe nile si di nke Uzaia nna-ya mere, otú a ka o mere.

35 Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe di elu nile. Onye ahu wuru ọnu-uzọ-ama ulo Jehova nke di n’elu.

36 Ma okwu Jotam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

37 Na mb͕e ahu ka Jehova malitere izite Rezin, bú eze Siria, na Peka nwa Remalaia, imegide Juda.

38 Jotam we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà, n’obodo Devid nna-ya: Ehaz nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 16

1 N’arọ nke-iri-na-asa nke Peka nwa Remalaia ka Ehaz nwa Jotam, bú eze Juda, malitere ibu eze.

2 Orú arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n’anya Jehova, bú Chineke-ya, dika Devid nna-ya.

3 Ma o jere ije n’uzọ ndi-eze Israel. Ọzọ kwa, o mere ka nwa-ya nwoke gabiga nime ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n’iru umu Israel.

4 Ọ chua àjà, sure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe nile di elu, na n’elu ugwu ntà nile, na n’okpuru osisi ndu ọ bula.

5 Mb͕e ahu Rezin, bú eze Siria, na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rigoruru Jerusalem ibu agha: ha we nọchigide Ehaz n’agha, ma ha apughi ibu agha.

6 Na mb͕e ahu ka Rezin, bú eze Siria, weghachiri Ilat nye Siria, chupu ndi-Ju n’Ilot: ndi Siria we ba n’Ilat, biri n’ebe ahu, rue ta.

7 Ehaz we zigara Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, ndi-ozi, si, Orù-gi na nwa-gi ka m’bu: rigota, zọputam n’aka eze Siria na n’aka eze Israel, ndi nēbili imegidem.

8 Ehaz we chiri ọla-ọcha na ọla-edo anāchọta n’ulo Jehova, na n’àkù nile nke ulo eze, zigara eze Asiria ka ọ buru ihe-iri-ngo.

9 Eze Asiria we ge ya nti: eze Asiria we rigorue Damaskọs, were ya, me ka ndi-ya je biri na Kia, o me-kwa-ra ka Rezin nwua.

10 Eze, bú Ehaz, we je izute Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, na Damaskọs, we hu ebe-ichu-àjà nke di na Damaskọs: eze, bú Ehaz, we zigara Uraija, bú onye-nchu-àjà, oyiyi ebe-ichu-àjà ahu, na ihe-atù-ya, dika ọlu nile aluru ya si di.

11 Uraija, bú onye-nchu-àjà, we wue ebe-ichu-àjà ahu: dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs zite, otú a ka Uraija, bú onye-nchu-àjà, mere, rue mb͕e eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs bia.

12 Eze we si na Damaskọs bia, eze we hu ebe-ichu-àjà ahu: eze we biarue ebe-ichu-àjà ahu nso, sure àjà-nsure-ọku n’elu ya.

13 Ọ we sure àjà-nsure-ọku-ya ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, sure kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, wusi kwa àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, wusa kwa ọbara àjà-udo-ya nile, n’elu ebe-ichu-àjà ahu.

14 Ma ebe-ichu-àjà ọla ahu, nke di n’iru Jehova, o si n’iru ulo ahu, si n’etiti ebe-ichu-àjà-ya na ulo Jehova, bute ya nso, tiye ya n’akuku Ugwu ebe-ichu-àjà-ya.

15 Eze, bú Ehaz, we nye Uraija, bú onye-nchu-àjà, iwu, si, N’elu ebe-ichu-àjà uku ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku ututu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, na àjà-nsure-ọku nke eze, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, ha na àjà-nsure-ọku nke ndi nile nke ala nka, na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha; ọbara nile nke àjà-nsure-ọku, na ọbara nile nke àjà, n’elu ya ka i gāwusa kwa ya: ma ebe-ichu-àjà ọla ahu gādirim iji ju ase.

16 Uraija, bú onye-nchu-àjà, we me ya, dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, nyere ya n’iwu.

17 Eze, bú Ehaz, we bipu ihe-njikọ nile nke ihe-ndọkwasi nile, si n’elu ha wezuga ite ọsisa-miri: o si-kwa-ra n’elu ehi ọla nke di n’okpuru ya weda oké osimiri ahu, tiye ya n’elu pavement nkume.

18 Ma uzọ ekpuru ekpu nke ubọchi-izu-ike nke ha wuru n’ulo ahu, na nbata eze nke di n’èzí, ọ b͕anwere ha rue ulo Jehova, n’ihi eze Asiria.

19 Ma ihe Ehaz nile nke fọduru nke o mere, èdeghi ihe ahu n’akukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

20 Ehaz we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Devid: Hezekaia nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 17

1 N’arọ nke-iri-na-abua nke Ehaz, bú eze Juda, ka Hoshea nwa Ila malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ iteghete.

2 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, nání na o meghi dika ndi-eze Israel ndi buru ya uzọ.

3 Ya ka Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide; Hoshea we ghọ orù-ya, butere ya onyinye-inata-iruọma.

4 Eze Asiria we hu nkekọta-madu imegide ya n’aru Hoshea; n’ihi na o zigara So, bú eze Ijipt, ndi-ozi, ma o bugoghi onyinye-inata-iru-ọma inye eze Asiria, dika ọ nēme kwa-arọ: eze Asiria we mechibido ya, ke ya ab͕u n’ulo-nkpọrọ.

5 Eze Asiria we rigo n’ala ahu nile, rigorue Sameria, nọchigide ya n’agha arọ atọ.

6 N’arọ nke-iteghete nke Hoshea ka eze Asiria were Sameria, me ka Israel je biri n’Asiria, me ka ha biri nime Hala, na nime Haboa, n’osimiri Gozan, na n’obodo ndi Midia.

7 O rue, n’ihi na umu Israel mehiere megide Jehova, bú Chineke-ha, Onye nēme ka ha si n’ala Ijipt, si n’okpuru aka Fero, bú eze Ijipt, rigoputa, n’ihi na ha tu-kwa-ra egwu chi di iche iche ọzọ,

8 we jeghari n’ukpuru nile nke mba ọzọ, bú ndi Jehova napuru ala-ha n’iru umu Israel, na n’ukpuru ndi-eze Israel, nke ha mere.

9 Umu Israel we were nzuzo me ihe nke nēzighi ezi megide Jehova, bú Chineke-ha, ha we wuere onwe-ha ebe di elu n’obodo-ha nile, site n’ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike.

10 Ha guzo-kwa-ra ogidi na Asherim nye onwe-ha n’elu ugwu ọ bula di elu, na n’okpuru osisi ndu ọ bula:

11 ha we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe ahu n’ebe nile di elu, dika mba ọzọ mere, bú ndi Jehova mere ka ha je biri n’ala ọzọ n’iru ha; ha me-kwa-ra ihe ọjọ di iche iche ikpasu Jehova iwe:

12 ha we fè arusi di iche iche òfùfè, nke Jehova siri ha, Unu emela ihe a.

13 Jehova we b͕ara Israel àmà, b͕a-kwa-ra Juda, site n’aka onye-amuma ọ bula, na onye-ọhu-uzọ ọ bula, si, Sinu n’uzọ ọjọ nile unu laghachi, debe ihe nile M’nyere n’iwu, na ukpurum nile, dika iwu ahu nile si di nke M’nyere nna-unu-hà n’iwu, nke M’zite-kwa-ra unu n’aka ndi-orùm, bú ndi-amuma.

14 Ma ha anughi, kama ha kwesiri olu-ha ike, dika olu ndi bu nna-ha, ndi nēkweghi na Jehova, bú Chineke-ha.

15 Ha we ju ukpuru-Ya nile, na ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na ndi bu nna-ha b͕ara, na ihe-àmà-Ya nile nke Ọ b͕ara ha; ha we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu, soro mba ọzọ ndi nọ ha buruburu, ndi Jehova nyere ha iwu bayere ha, ka ha ghara ime dika ha.

16 Ha we rapu ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n’iwu, ha we mere onwe-ha arusi awuru awu, bú umu-ehi abua, me kwa Ashera, kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè Beal òfùfè.

17 Ha me-kwa-ra ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gabiga nime ọku, ha nāju kwa ase, nāb͕a afa, re onwe-ha ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, ikpasu Ya iwe.

18 Jehova we wesa Israel iwe nke-uku, si n’iru Ya wezuga ha: ọ dighi ndi fọduru, nābughi ebo Juda, nání ya.

19 Juda edebeghi kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n’iwu, kama ha jeghariri n’ukpuru nile nke Israel nke ha mere.

20 Jehova we ju nkpuru nile nke Israel, weda ha n’ala, nye ha n’aka ndi nāpunara madu ihe, rue mb͕e O siri n’iru Ya chupu ha.

21 N’ihi na Ọ dọwapuru Israel n’ulo Devid; ha we me Jeroboam nwa Nebat eze: Jeroboam we chuputa Israel n’iso Jehova, o we me ka ha mehie nmehie uku.

22 Umu Israel we jegharia nime nmehie nile nke Jeroboam, nke o mere; ha esighi nime ha wezuga onwe-ha;

23 rue mb͕e Jehova siri n’iru Ya wezuga Israel, dika O kwuru site n’aka ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma. Ewe me ka Israel si n’elu ala-ha je biri n’Asiria, rue ta.

24 Eze Asiria we me ka madu si na Babilon, si kwa na Kuta, si Kwa n’Ava, si kwa na Hemat na Sefavaim, bia, o me ka ha biri n’obodo nile nke Sameria n’ọnọdu umu Israel: ha we nweta Sameria, biri n’obodo-ya nile.

25 O rue, na nmalite obibi-ha n’ebe ahu, na ha atughi egwu Jehova: Jehova we zìe ọdum n’etiti ha, ha we nēb͕u ufọdu nime ha.

26 Ha we gwa eze Asiria okwu, si, Mba ndi i mere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú ndi i mere ka ha biri n’obodo Sameria, ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu: O we zìe ọdum n’etiti ha, ma, le, ha nēme ka ha nwua, n’ihi na ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu.

27 Eze Asiria we nye iwu, si, Me ka otù onye nime ndi-nchu-àjà je n’ebe ahu, bú ndi unu mere ka ha si n’ebe ahu je biri n’ala ọzọ; ka ha je kwa biri n’ebe ahu, ka o zí kwa ha ikpé Chineke ala ahu:

28 Otù onye nime ndi-nchu-àjà ahu ndi ha mere ka ha si na Sameria je biri n’ala ọzọ we bia biri na Bet-el, we nēzí ha otú ha gātu egwu Jehova.

29 Ha we nēme, mba ọ bula chi nke aka ya, ha we dọba ha n’ulo nke ebe di elu nke ndi Sameria mere, mba ọ bula n’obodo-ha ebe ha onwe-ha nēbi.

30 Ndikom Babilon we me Sukot-benot, ndikom Kut me-kwa-ra Neagal, ndikom Hemat me-kwa-ra Ashima,

31 ndikom Ava me-kwa-ra Nibaz na Tatak, ma ndi Sefavaim nēsurere Adramelek na Anamelek umu-ha n’ọku, bú chi abua nke Sefavaim.

32 Ha we nātu egwu Jehova, mere onwe-ha ndi-nchu-àjà nke ebe nile di elu sitere n’ọnu-ọgugu-ha nile, ha we nēmere ha ihe n’ulo nke ebe nile di elu.

33 Jehova ka ha nātu egwu, ma chi di iche iche nke aka ha ka ha nēfè, dika ikpé mba nile si di, bú ndi emere ka ha si n’ebe ahu je biri n’ala ọzọ.

34 Rue ta ndi ahu nēme dika ikpé mbu nile si di: ha adighi-atu egwu Jehova, ha adighi-eme kwa dika ukpuru nile ha si di, ma-ọbu dika ikpé-ha si di, ma-ọbu dika iwu si di, ma-ọbu dika ihe enyere n’iwu si di, nke Jehova nyere umu Jekob n’iwu, bú onye Ọ guru aha-ya Israel;

35 Jehova we soro ha b͕a ndu, nye ha iwu, si, Unu atula egwu chi di iche iche ọzọ, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu achu-kwara-la ha àjà:

36 kama Jehova, Onye were ike uku na ogwe-aka esetiri eseti me ka unu si n’ala Ijipt rigoputa, Ya ka unu gātu egwu, Ya ka unu gākpọ kwa isi ala nye, Ya ka unu gāchu-kwa-ra àjà:

37 ukpuru nile na ikpé nile na iwu na ihe enyere n’iwu, nke O dere n’akwukwọ nye unu, ndia ka unu gēlezi kwa anya ime ubọchi nile; ma unu atula egwu chi di iche iche ọzọ:

38 ma ọb͕ub͕a-ndu Mu na unu b͕ara, unu echezọla ya; unu atu-kwa-la egwu chi di iche iche ọzọ:

39 kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gātu egwu; Ya onwe-ya gānaputa kwa unu n’aka ndi-iro-unu nile.

40 Ma ha anughi, kama dika ikpé mbu ha si di ka ha onwe-ha nēme.

41 Mba ndia we nātu egwu Jehova, ma ọ bu arusi nile ha apiri api ka ha nēfè; umu-ha kwa, na umu umu-ha, dika ndi bu nna-ha mere, otú a ka ha onwe-ha nēme rue ta.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 18

1 O rue, n’arọ nke-atọ nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Hezekaia nwa Ehaz, bú eze Juda, malitere ibu eze.

2 Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Abi nwa-nwayi Zekaraia.

3 O me ihe ezi ziri n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.

4 Ya onwe-ya wezugara ebe nile di elu, titue ogidi nile, b͕utue Ashera: o tipia-kwa-ra agwọ ọla nke Moses mere; n’ihi na rue mb͕e ahu umu Israel nēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpọ ya Nehushtan.

5 Ọ bu na Jehova, bú Chineke Israel, ka ọ tukwasiri obi; mb͕e ọ nwusiri ọ dighi kwa onye ọzọ di ka ya n’etiti eze nile nke Juda, ma-ọbu n’etiti ndi buru ya uzọ.

6 O we rapara Jehova n’aru, o sighi n’iso Ya wezuga onwe-ya, o we debe ihe nile O nyere n’iwu, bú nke Jehova nyere Moses n’iwu.

7 Jehova nọye-kwa-ra ya; n’ebe o bula ọ nāpu o nwere uche: o we nupu isi n’okpuru eze Asiria, o fèghi kwa ya òfùfè.

8 Ya onwe-ya tib͕uru ndi Filistia rue Geza na ókè-ala-ya nile, site n’ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike.

9 O rue, n’arọ nke-anọ nke eze, bú Hezekaia, nke ahu bu arọ nke-asa nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide Sameria, nọchigide ya n’agha.

10 Ha we were ya n’ọgwugwu arọ atọ: ọ bu n’arọ nke-isi nke Hezekaia, nke ahu bu arọ nke-iteghete nke Hoshea, bú eze Israel, ka ewere Sameria.

11 Eze Asiria we me ka Israel je biri n’Asiria, o we me ka ha nọdu nime Hala na nime Haboa, n’osimiri Gozan, na n’obodo ndi Midia:

12 n’ihi na ha egeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, we gabiga ọb͕ub͕a-ndu-Ya, bú ihe nile nke Moses, bú orù Jehova, nyere n’iwu, ha anughi kwa ya, ha emeghi kwa ya.

13 Ma n’arọ nke-iri-na-anọ nke eze, bú Hezekaia, Senakerib, bú eze Asiria, rigoro imegide obodo nile ewusiri ike nke Juda, were ha.

14 Hezekaia, bú eze Juda, we zigara eze Asiria ozi rue Lekish, si, Emehiewom; si n’ebe m’nọ laghachi: ihe i gēbom m’gēburu ya. Eze Asiria we tukwasi Hezekaia, bú eze Juda, ọgu talent ọla-ọcha iri-na-ise na orú talent ọla-edo na iri.

15 Hezekaia we nye ya ọla-ọcha nile nke anāchọta n’ulo Jehova, na n’àkù nile nke ulo eze.

16 Na mb͕e ahu ka Hezekaia bipuru ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Jehova, na ogidi nile nke Hezekaia, bú eze Juda, jiri ọla-edo machita, o were ha nye eze Asiria.

17 Eze Asiria we si na Lekish zie Tatan na Rab-saris na Rabshake jekuru eze, bú Hezekaia, ha na oké usu-ndi-agha, rue Jerusalem. Ha we rigo biarue Jerusalem. Ha we rigo, bia, guzo n’akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n’elu, nke di n’uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà.

18 Ha we kpọ eze òkù, Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ha.

19 Rabshake we si ha, Biko, sinu Hezekaia, Otú a ka eze uku ahu siri, bú eze Asiria, Gini bu ntukwasi-obi a nke i ji tukwasi obi?

20 I nāsi, (ma ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu) Ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha. Ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n’okpurum?

21 Ub͕u a, le, i tukwasiworo onwe-gi obi n’aru nkpa-n’aka amì a piara apia, bú n’aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n’ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n’ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ.

22 Ma ọ buru na unu asim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu onye Hezekaia wezugara ebe nile Ya di elu na ebe-ichu-àjà-ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N’iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala nime Jerusalem?

23 Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m’nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha.

24 Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n’aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya?

25 Ub͕u a ọ̀ bu n’ejighi Jehova ka m’rigoro imegide ebe a ibibi ya?

26 Jehovah sirim, Rigo imegide ala nka, bilie ya. Elaiakim nwa Hilkaia, na Shebna, na Joa, we si Rabshake, Biko, gwa ndi orù-gi okwu n’asusu Siria; n’ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: akpaye-kwa-la ayi uka n’asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n’elu mb͕idi.

27 Rabshake we si ha, Ọ̀ bu n’ihi onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n’ihi ndikom ahu ndi nānọdu n’elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha ṅu kwa nwa-miri-ha?

28 Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n’asusu ndi-Ju, kwue, si, Nurunu okwu eze uku ahu, bú eze Asiria.

29 Otú a ka eze siri, Unu ekwela ka Hezekaia rafue unu; n’ihi na ọ pughi inaputa unu n’aka-ya:

30 unu ekwe-kwa-la ka Hezekaia me ka unu tukwasi Jehova obi, si, Jehova aghaghi inaputa ayi, agaghi-enye kwa obodo a n’aka eze Asiria.

31 Unu egela Hezekaia nti: n’ihi na otú a ka eze Asiria siri, Merenum ihe-ngọzi, pukutekwam; ri-kwa-nu, nwoke ọ bula nkpuru vine-ya, na nwoke ọ bula nkpuru osisi fig ya, ṅu-kwa-nu, nwoke ọ bula miri olùlù-miri-ya;

32 rue mb͕e m’biara chiri unu je n’ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine, ala manu olive na manu-aṅu, ka unu we di ndu, ghara inwu: unu ege-kwa-la Hezekaia nti, mb͕e ọ nārafu unu, si, Jehova gānaputa ayi.

33 Chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo, onye ọ bula ala-ya, n’aka eze Asiria ma-ọli?

34 Òle ebe chi nile nke Hemat na Apad di? òle ebe chi nile nke Sefavaim na Hina na Iva di? hà anaputawo Sameria n’akam?

35 Òle ndi n’etiti chi nile nke ala dum ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n’akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n’akam?

36 Ma ndi-Ju b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n’ihi na ihe eze nyere n’iwu bu nka, si, Unu azala ya.

37 Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 19

1 O rue, mb͕e eze, bú Hezakaia, nuru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, were ákwà-nkpe kpuchie onwe-ya, ba n’ulo Jehova.

2 O we zìe Elaiakim, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na ndi-okenye ndi-nchu-àjà, ndi wereworo ákwà-nkpe kpuchie onwe-ha, o we zìe ha jekuru Aisaia, bú onye-amuma, nwa Emoz.

3 Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n’ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha.

4 Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: buli kwa ekpere-gi n’ihi ndi fọduru ndi ahutaworo.

5 Ndi-orù eze, bú Hezekaia, we biakute Aisaia.

6 Aisaia we si ha, Otú a ka unu gāsi onye-nwe-unu, Otú a ka Jehova siri, Atula egwu n’ihi okwu nile nke i nuworo, nke ndi nējere eze Asiria ozi jiri kwulum.

7 Le, M’nētiye otù mọ nime ya, ọ gānu kwa akukọ, laghachi n’ala-ya; M’gēme kwa ka ọ da site na mma-agha n’ala-ya.

8 Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka o nēbuso Libna agha: n’ihi na ọ nuru na o siwo na Lekish bulie ije.

9 O we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Le, ọ putawo ibuso gi agha: o we zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia ọzọ, si,

10 Otú a ka unu gāgwa Hezekaia, bú eze Juda, okwu, si, Ekwela ka Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nātukwasi obi, rafue gi, si Agaghi-enye Jerusalem n’aka eze Asiria.

11 Le, gi onwe-gi anuwo ihe ndi-eze Asiria meworo ala nile, n’iwezuga ha ka ebibie ha: àgānaputa kwa gi onwe-gi?

12 Chi nile nke mba nile ọzọ hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Edem, ndi nọ na Telasa?

13 Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva?

14 Hezekaia we nata akwukwọ n’aka ndi-ozi ahu, gua ha: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n’iru Jehova.

15 Hezekaia we kpe ekpere n’iru Jehova, si, Jehova, bú Chineke Israel, Onye nēbi n’etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa.

16 Jehova, tọ nti-Gi n’ala, nu; Jehova, saghe anya-Gi abua, hu: nu kwa okwu nile nke Senakerib, nke o jiri zite ya ita Chineke di ndu uta.

17 N’ezi-okwu, Jehova, ndi-eze Asiria emewo ka mba nile na ala nile ha tọb͕ọrọ n’efu,

18 ha etiyewo kwa chi nile ha n’ọku, n’ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n’ihì.

19 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, biko, zọputa ayi n’aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke, nání Gi.

20 Aisaia nwa Emoz we zigara Hezekaia ozi, si, Otú, a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ekpere nke i kpeworom bayere Senakerib, bú eze Asiria, anuwom ya.

21 Nka bu okwu nke Jehova kwuworo bayere ya: Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Zaion, elelìwo gi anya, chìnye gi ihere n’iru; ada Jerusalem efufewo isi n’azu gi.

22 Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.

23 I siri n’aka ndi-ozi-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu ime, rue akuku nile Lebanon; m’gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m’gābà kwa n’ebe-nnọdu-abali nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.

24 Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri ala ọzọ, m’gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia.

25 Ì nughi na ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka M’meworo ya, na ọ bu n’ubọchi mb͕e ochie ka M’kpuworo ya? ub͕u a emewom ka ọ biarue, na i gābu onye gākwada obodo ewusiri ike ka ha we ghọ obo tọb͕ọrọ n’efu.

26 Ndi bi nime ha we ghọ ndi aka-ha di nkpunkpu, ha turu ujọ ihere we me ha; ha ghọrọ ihe-ọkukú nke ubi, na akwukwọ ahihia ndu, na ahihia nke elu-ulo, na ọka chanwuru achanwu tutu o tolite.

27 Ma amawom nnọdu-gi, na ọpupu-gi, na nbata-gi, na otú i nākpali onwe-gi imegidem.

28 N’ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n’ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M’gētiye kwa nb͕a-aka-imim n’imi-gi, na bridle nkem n’eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n’uzọ ahu nke i siri bia.

29 Ma nka gāburu gi ihe-iriba-ama: unu gēri n’arọ a ihe nēpu n’onwe-ya, na n’arọ nke-abua ihe si na nke ahu pue; ma n’arọ nke-atọ ghanu nkpuru, we kwa ihe ubi, ku kwa vine n’ubi-vine, ri kwa nkpuru-ha.

30 Ndi b͕apuru ab͕apu nke ulo Juda ndi fọduru gāb͕agide kwa nkpọrọgwu n’ala n’okpuru ọzọ, mi kwa nkpuru n’elu.

31 N’ihi na ọ bu na Jerusalem ka ndi fọduru afọdu gēsi puta, ndi b͕apuru ab͕apu gāputa kwa n’ugwu Zaion: ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.

32 N’ihi ya ka Jehova kwuru okwu bayere eze Asiria otú a, si, Ọ gaghi-abà n’obodo a, ọ gaghi-ab͕a kwa otú àkú n’ebe ahu, ọ gaghi-ewere kwa ọta bia n’iru ya, ọ gaghi-awukọta kwa ihe-ntukọba imegide ya.

33 N’uzọ o siri bia, n’uzọ ahu ka ọ gālaghachi, ọ gaghi-abà kwa n’obodo a, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

34 M’gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n’ihi Onwem, na n’ihi Devid, bú orùm.

35 O rue, n’abali ahu, na mọ-ozi nke Jehova puru, tib͕ue n’ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n’isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.

36 Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve.

37 O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n’ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n’ala Ararat. Isa-hadon nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 20

1 Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n’ihi na gi onwe-gi nānwu anwu, i gaghi-adi kwa ndu.

2 O we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova, si,

3 Biko, Jehova, biko, cheta otú m’jeghariworo n’iru Gi n’ezi-okwu na n’obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n’anya-Gi ka m’meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.

4 O rue, mb͕e Aisaia akāpughi ba n’etiti obodo, na okwu Jehova ruru ya nti, si,

5 Jeghachi, si Hezekaia, bú onye-ndú ndim, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M’nēme ka aru-gi di ike: n’ubochi nke-atọ i gārigoru ulo Jehova.

6 M’gātukwasi kwa arọ iri na ise n’ubọchi-gi, naputa kwa gi na obodo a n’ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a n’ihi Onwem na n’ihi Devid, bú orùm.

7 Aisaia we si, Werenu mbadamba fig. Ha we were ya tukwasi ya n’elu ihe-ofifi ahu, o we diri ndu.

8 Hezekaia we si Aisaia, Gini gābu ihe-iriba-ama na Jehova gēme ka arum di ike, m’we rigorue ulo Jehova n’ubọchi nke-atọ?

9 Aisaia we si, Nka gāburu gi ihe-iriba-ama sitere n’aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru: onyinyo, ọ̀ gāga n’iru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, ma-ọbu la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri?

10 Hezekaia we si, Ọ di nfe ka onyinyo ruru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri: é-è, kama ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri.

11 Aisaia, bú onye-amuma, we kpọkue Jehova: O we me ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, nke ọ ridara na nzọ-ukwu ebe-nrigo Ehaz.

12 Na mb͕e ahu Berodak-baladan nwa Baladan, bú eze Babilon, zigara Hezekaia akwukwọ na onyinye-inata-iru-ọma: n’ihi na ọ nuru na Hezekaia riarárí ọria.

13 Hezekaia we ge ha nti, me ka ha hu ulo nile nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n’àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n’ulo-ya, ma-ọbu n’ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu.

14 Aisaia, bú onye-amuma, we biakute eze, bú Hezekaia, si ya, Gini ka ndikom ndia siri gi? òle ebe ka ha si kwa biakute gi? Hezekaia we si, Ọ bu n’ala di anya ka ha si bia, bú Babilon.

15 Ọ si, Gini ka ha huru n’ulo-gi? Hezekaia we si, Ihe nile nke di n’ulom ka ha huru: ọ dighi ihe di n’àkùm nile nke m’nēmeghi ka ha hu.

16 Aisaia we si Hezekaia, Nuru okwu Jehova.

17 Le, ubọchi nābia, na ihe nile di n’ulo-gi, na nke nna-gi-hà debeworo n’ulo-àkù rue ta, agēburu ha je Babilon: ọ dighi ihe gāfọdu, ka Jehova siri.

18 Ufọdu kwa nime umu-gi ndikom, ndi gēsi n’aru-gi puta, ndi i gāmuta, ha gāchiri ha; ha gābu kwa ndi-onozi n’ulo uku eze Babilon.

19 Hezekaia we si Aisaia, Ọ di nma, bú okwu Jehova nke i kwuworo. Ọ si kwa, Ọ̀ bughi otú a, ma ọ buru na udo na ezi-okwu adi n’ubọchim nile?

20 Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na otú o mere ọdọ-miri, na uzọ-miri, we me ka miri rubata n’obodo, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

21 Hezekaia we so nna-ya-hà dina n’ọnwu: Manase nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.