Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 1

1 Moab we jehie megide Israel mb͕e ọnwu Ehab gasiri.

2 Ehazaia we dapu n’ihe-ọkpukpa window nke ime-ulo-elu-ya nke di na Sameria, o we ria ọria: o ziga ndi-ozi, si ha, Jenu, jua Beal-zebub, bú chi Ekron, ase ma m’gādiri ndu n’ọria nka.

3 Ma mọ-ozi Jehova gwara Elaija, bú onye Tisbe, okwu, si, Bilie, rigo izute ndi-ozi eze Sameria, gwa ha okwu, si, Ọ̀ bu n’ihi na ọ dighi Chineke di n’Israel, na unu onwe-unu nēje iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase?

4 Ma n’ihi nka otú a ka Jehova siri, Ihe-ndina ahu ebe i rigoro, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu. Elaija we la.

5 Ndi-ozi ahu we laghachikuru ya, ọ si ha, Gini bu nka na unu laghachiworo?

6 Ha si ya, Otù nwoke rigotara izute ayi, ọ si ayi, Jenu, laghachikuru eze nke zìri unu, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu n’ihi na ọ dighi Chineke di n’Israel na gi onwe-gi nēziga iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase? n’ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.

7 Ọ si ha, Òle aha madu ọ bu, bú nwoke ahu nke rigoro izute unu, we gwa unu okwu ndia?

8 Ha si ya, Ọ bu nwoke nwere aji nke-uku, eke-kwa-ra ya ihe-ọkiké akpukpọ n’úkwù-ya. Ọ si, Elaija onye Tisbe ka ọ bu.

9 O we zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. O we rigokuru ya: ma, le, ọ nānọdu n’elu ugwu. O we gwa ya okwu, si, Gi onye nke Chineke, Eze asiwo, Ridata.

10 Elaija we za, si onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ahu, Ọ buru na onye nke Chineke ka m’bu, ka ọku si n’elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku we si n’elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.

11 O we ziga-kwa-ra ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ọzọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Ọ za, si ya, Onye nke Chineke, otú a ka eze siworo, Ngwa ngwa, ridata.

12 Elaija we za, si ha, Ọ buru na onye nke Chineke ka m’bu, ka ọku si n’elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku nke Chineke we si n’elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.

13 Ọ we ziga kwa onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia b͕ue ikperè-ya n’ala n’iru Elaija, riọ ya amara, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum, na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia, di oké ọnu-ahia n’anya-gi.

14 Le, ọku siri n’elu-igwe ridata, ripia ndi-isi abua mbu ahu nke ọgu ndi-agha abua na iri, ha na ọgu ndi-agha abua na iri ha: ma ub͕u a ka ndum di oké ọnu-ahia n’anya-gi.

15 Mọ-ozi nke Jehova we si Elaija, Soro ya rida: atula egwu ya. O we bilie, soro ya ridakuru eze.

16 O we gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N’ihi na i zigawo ndi-ozi iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase, ọ̀ bu n’ihi na ọ dighi Chineke di n’Israel iju ase okwu-Ya? n’ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.

17 O we nwua, dika okwu Jehova si di nke Elaija kwuru. Jehoram we malite ibu eze n’ọnọdu ya n’arọ nke-abua nke Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda; n’ihi na o nweghi nwa-nwoke.

18 Ma ihe Ehazaia nile nke fọduru nke o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 2

1 O rue, mb͕e Jehova gaje ime ka Elaija rigorue elu-igwe n’oké ifufe, na Elaija siri na Gilgal je, ya na Elaisha.

2 Elaija we si Elaisha, Biko, nọdu n’ebe a; n’ihi na Jehova ezigawom ijeru Bet-el, Elaisha we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m’gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we ridarue Bet-el.

3 Umu ndi-amuma ndi nọ na Bet-el we pukute Elaisha, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n’ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti.

4 Elaija we si ya, Elaisha, biko, nọdu n’ebe a; n’ihi na Jehova ezigawom ijeru Jeriko. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m’gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we biarue Jeriko.

5 Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko we biarue Elaisha nso, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n’ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti.

6 Elaija we si ya, Biko, nọdu n’ebe a; n’ihi na Jehova ezigawom ijeru Jọdan. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m’gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha abua we je.

7 Ọgu ndikom abua na iri n’etiti umu ndi-amuma je-kwa-ra, guzo na ncherita-iru ha n’ebe di anya: ha abua we guzo n’akuku Jọdan.

8 Elaija we chiri uwe – nwuda – ya, piakọta ya, tie miri ahu, ewe kera ya, otù uzọ ga n’otù akuku, otù uzọ ga n’akuku ọzọ, ha abua we gabiga n’ala-akọrọ.

9 O rue, mb͕e ha gabigasiri, na Elaija siri Elaisha, Riọ ihe m’gēmere gi, tutu ewepum n’ebe i nọ. Elaisha we si, Biko, ka òkè abua nke mọ-gi dikwasim.

10 Ọ si, I riọwo ihe siri ike: ma ọ buru na i hum mb͕e anēwepum n’ebe i nọ, ọ gādiri gi otú a; ma ọ buru na i hughm, ọ gaghi-adi otú a.

11 O rue na, mb͕e ha nọ nēje, nēje ije nēkwu kwa okwu, le, ub͕ọ-ala ọku na inyinya ọku, nke kewara ha abua; Elaija we rigorue elu-igwe n’oké ifufe.

12 Ma Elaisha nēle ya anya; ya onwe-ya nēti kwa nkpu, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya! ma ọ hughi ya ọzọ: o we jide uwe nke aka ya, dọwa ha ibe abua.

13 Ọ chili kwa uwe-nwuda Elaija, nke danariri ya, ọ laghachi, guzo n’usọ Jọdan.

14 O we chiri uwe-nwuda Elaija, nke danariri ya, o we tie miri, si, Òle ebe Jehova nọ, bú Chineke Elaija? Ya onwe-ya kwa, o we tie miri, ewe kera ya otù uzọ ga n’otù akuku, otù uzọ ga n’akuku ọzọ; Elaisha we gabiga.

15 Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko na ncherita-iru ya we hu ya, si, Mọ Elaija anọkwasiwo Elaisha. Ha we bia izute ya, ha we kpọrọ ya isi ala.

16 Ha we si ya, Biko, le, ọgu ndikom abua na iri, bú ndi-dìnkpà, nọ n’etiti ndi-orù-gi n’ebe a; biko, ka ha je, chọ onye-nwe-gi: eleghi anya Mọ nke Jehova eweliwo ya, tuda ya n’otù ugwu, ma-ọbu n’otù ndagwurugwu. Ọ si, Unu ezigala.

17 Ha we rugide ya rue mb͕e ihere mere ya, o we si, Ziganu. Ha we ziga ọgu ndikom abua na iri; ha we chọ ya ubọchi atọ, ma ha achọtaghi ya.

18 Ha we laghachikuru ya, ma ya onwe-ya nānọ na Jeriko; ọ si ha, Àsighm unu, Ejela?

19 Ndikom obodo ahu we si Elaisha, Biko, le, ọnọdu obodo a di nma, dika onye-nwem nāhu: ma miri-ya jọrọ njọ, ala nādighi-ekwe kwa ka ihe ka aka.

20 Ọ si, Wetaranum ọkwa ọhu, tiye-kwa-nu nnú nime ya. Ha we wetara ya.

21 Ọ pua je n’ebe miri si asuputa, o we tubà nnú n’ebe ahu, si, Otú a ka Jehova siri, Emewom ka miri a buru ihe inye ezi-ndu; ọnwu ma-ọbu ala nādighi-ekwe ka ihe ka aka agaghi-adi kwa ọzọ site n’ebe ahu.

22 Ewe me ka miri ahu buru ihe inye ezi-ndu rue ta, dika okwu Elaisha si di, nke o kwuru.

23 O si n’ebe ahu rigorue Bet-el: ma mb͕e ya onwe-ya nārigo n’uzọ, umu-okoro siri n’obodo puta, we kwa ya emò, si ya, Rigo, onye-isi-nkwọcha; rigo, onye-isi-nkwọcha.

24 Ọ le anya n’azu-ya, hu ha, kọcha ha n’aha Jehova. Nne anu-ọhia bear abua we si n’oké ọhia puta, dọka ọgu umu-okoro abua na abua n’etiti ha.

25 O si n’ebe ahu jerue ugwu Kamel, si kwa n’ebe ahu laghachi na Sameria.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 3

1 Ma Jehoram nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n’arọ nke-iri-na-asatọ nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze arọ iri na abua.

2 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova; nání na o meghi dika nna-ya, na dika nne-ya: o wezuga ogidi Beal nke nna-ya mere.

3 Otú ọ di, ọ rapara na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie; o wezugaghi onwe-ya nime ya.

4 Ma Misha, bú eze Moab, bu onye-nwe ìgwè anu-ulo; o we tuara eze Israel utu aji nke orú nnù umu-aturu uzọ iri-na-abua na nnù iri, na nke orú nnù ebulu uzọ iri-na-abua na nnù iri.

5 O rue, mb͕e Ehab nwuru, na eze Moab jehiere megide eze Israel.

6 Eze, bú Jehoram, we si na Sameria pua n’ubọchi ahu, gukọta Israel nile.

7 O je kwa, zigara Jehoshafat, bú eze Juda, ozi, si, Eze Moab ejehiewo megidem: ì gēsorom jekuru Moab ibu agha? Ọ si, M’gārigo: dika m’di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di.

8 Ọ si, Òle nke bu uzọ ayi gēsi rigo? Ọ si, Uzọ ọzara Edom.

9 Eze Israel we je, ya na eze Juda, na eze Edom: ha we ga ije ubọchi asa buruburu: ma ọ dighi miri diri ọmuma-ulo-ikwū ahu, ma ọbu nke diri anu-ulo nke ha chiri je.

10 Eze Israel we si, Ewó! n’ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n’aka Moab.

11 Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ ebe a, ka ayi we jua Jehova ase site n’aka-ya? Otù nime ndi-orù eze Israel we za, si, Elaisha nwa Shefat nọ ebe a, onye wukwasiri miri n’aka Elaija.

12 Jehoshafat we si, Okwu Jehova di n’ebe ọ nọ. Eze Israel na Jehoshafat na eze Edom we ridakuru ya.

13 Elaisha we si eze Israel, Gini ka mu na gi nwekọrọ? jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi. Eze Israel we si ya, É-è: n’ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n’aka Moab.

14 Elaisha we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m’guzoworo n’iru Ya, n’ezie, ọ buru na ahughm Jehoshafat, bú eze Juda, iru-ọma, m’gaghi-elegide anya n’ebe i nọ ma-ọli, m’gaghi-ahu kwa gi anya ma-ọli.

15 Ma ub͕u a kutaranum ọkpọ-ubọ. O rue, mb͕e ọkpọ-ubọ ahu nākpọ, na aka Jehova di n’aru ya.

16 Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Me ndagwurugwu a ka ọ buru olùlù olùlù.

17 N’ihi na otú a ka Jehova siri, Unu agaghi-ahu ifufe, unu agaghi-ahu kwa oké miri-ozuzo, ma ndagwurugwu ahu gējuputa na miri: unu gāṅu kwa, unu onwe-unu, na anu-ulo-unu, na anumanu-unu nile.

18 Ma nka di nfe n’anya Jehova: Ọ gēnye kwa Moab n’aka-unu.

19 Unu gētib͕u kwa obodo ọ bula ewusiri ike, na obodo ọ bula kachasi nma, unu gēme kwa ka ezi osisi ọ bula da, unu gēkpochi kwa isi-iyi miri nile, were kwa nkume mebie ezi òkè ala-ubi ọ bula.

20 O rue n’ututu, na, mb͕e anēsure onyinye-inata-iru-ọma, le, miri nēsi n’uzọ Edom bia, ala we juputa na miri.

21 Moab nile we nu na ndi-eze ahu arigotawo ibuso ha agha, ha we kpọkọta onwe-ha, site n’onye ọ bula nke nēke onwe-ya ihe-ọkiké agha n’úkwù, we rigorue ndi bu okenye, ha we guzo n’ókè-ala-ha.

22 Ha we bilie n’isi-ututu, ma anyanwu mukwasiri miri ahu, Moab we hu miri ahu na ncherita-iru ha ka ọ nācha ọbara dika ọbara:

23 ha we si, Nka bu ọbara; ekpochapuwo ndi-eze ahu nọ̄, ha etib͕uwo kwa, nwoke ọ bula ibe-ya: ma ub͕u a, Moab, kwatanu ihe-nkwata.

24 Ha biarue ọmuma-ulo-ikwū Israel, Israel we bilie, tib͕ue Moab, ha we si n’iru ha b͕alaga: ha we ba nime ya nētib͕u Moab.

25 Ha we tipia obodo nile ha; ha nātubà kwa, nwoke ọ bula nkume-ya, n’ezi òkè ala-ubi ọ bula, tujue ya; ha nēkpochi kwa isi-iyi miri nile, me ka ezi osisi nile da: rue mb͕e ọ bu nání na Kia-hareset ka emere ka nkume-ya fọdu; ma ndi-ọma-èbè b͕ara ya buruburu, tib͕ue ya.

26 Eze Moab we hu na agha ahu di ike kari ya, o we chiri nnù ndikom na ọgu iri-na-ise tiyere onwe-ya, bú ndi nāmiputa mma-agha, itiwaru eze Edom:

27 O we were ọkpara-ya, nke gābu eze n’ọnọdu ya, sure ya ọku n’elu mb͕idi, ka ọ buru àjà-nsure-ọku. Oké iwe we di megide Israel: ha we si n’ebe ọ nọ bulie ije, laghachi n’ala-ha.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 4

1 Ma otù nwayi n’etiti ndinyom umu ndi-amuma tikuru Elaisha nkpu, si, Orù-gi, bú dim, anwuwo: ma gi onwe-gi amawo na orù-gi nātu egwu Jehova: ma onye-nbinye-ego abiawo ichiri n’onwe-ya umum abua ka ha buru orù.

2 Elaisha we si ya, Gini ka m’gēmere gi? gosim; gini ka i nwere n’ulo? Ọ si, Ọ dighi ihe ọ bula orù-gi nwayi nwere n’ulo, ọ bu nání ite manu.

3 Ọ si, Je, riọtara onwe-gi ihe n’èzí n’aka ndi-ab͕ata-obi-gi nile, bú ihe ihe nādighi nime ha; ha abula ole-na-ole.

4 I gābà kwa n’ulo, mechibido onwe-gi, mechibido kwa umu-gi ndikom, uzọ, b͕aye manu di n’ite ahu n’ihe ahu nile, buzuga nke juru eju.

5 O we si n’ebe ọ nọ la, mechibido onwe-ya, mechibido kwa umu-ya ndikom, uzọ; ha onwe-ha nēbutere ya ihe ahu nso, ma ya onwe-ya nāb͕aye ab͕aye.

6 O rue, mb͕e ihe nile juru, na ọ siri nwa-ya, Buterem nso ihe ọzọ. Ọ si ya, Ọ dighi ihe ọzọ di. Manu ahu we kwusi.

7 O we bia, gosi onye nke Chineke. Ọ si, Je, re manu ahu, kwua ugwọ-gi, gi onwe-gi na umu-gi ndikom were nke fọduru di ndu.

8 Ubọchi we rue, na Elaisha gabigara rue Shunem, ma otù nwayi uku nọ n’ebe ahu; o rugide ya ka o rie nri. O rue, mb͕e ọ bula ọ nāgabiga, na o wezugara onwe-ya ba n’ebe ahu iri nri.

9 Nwayi ahu we si di-ya, Biko, le, amawom na onye di nsọ nke Chineke ka ọ bu, bú onye a nagabiga n’akuku ayi mb͕e nile.

10 Biko, ka ayi me ime-ulo-elu ntà nke mb͕idi; ka ayi dọba-kwa-ra ya n’ebe ahu ihe-ndina, na table, na oche, na ihe-idọba-oriọna: o gēru kwa, mb͕e ọ biakutere ayi, na ọ gēwezuga onwe-ya ba n’ebe ahu.

11 Ubọchi we rue, na ọ biara n’ebe ahu, wezuga onwe-ya ba n’ime-ulo-elu ahu, dina n’ebe ahu.

12 Ọ si Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Kpọ nwayi Shunem nka. O we kpọ ya, o we guzo n’iru ya.

13 Elaisha we si Gihezi, Biko, si ya, Le, i werewo ncheb͕u a nile cheb͕u onwe-gi bayere ayi; gini ka agēmere gi? ọ̀ bu igwa eze okwu bayere gi, ma-ọbu igwa onye-isi usu-ndi-agha? Ọ si, N’etiti ndim ka mu onwem nēbi.

14 Ọ si, Gini kwa ka agēmere ya? Gihezi we si, N’ezie ọ nweghi nwa-nwoke, di-ya aghọwo kwa agadi.

15 Ọ si, Kpọ ya. O we kpọ ya, nwayi ahu we guzo n’ọnu-uzọ.

16 Ọ si, Na mb͕e nka akara àkà, dika mb͕e a aka-nile, gi onwe-gi ganāb͕aku nwa-nwoke. Ọ si, É-è, onye-nwem, gi onye nke Chineke, agwala orù-gi nwayi okwu-ugha.

17 Nwayi ahu we turu ime, mua nwa-nwoke na mb͕e ahu akara àkà, dika mb͕e ahu aka-nile, otú Elaisha gwara ya.

18 Nwata ahu we toputa, ubọchi we rue, na ọ pukuru nna-ya jekuru ndi nēbì ọka.

19 Ọ si nna-ya, Isim, isim. O we si nwa-okorọbia-ya, Kuru ya bakuru nne-ya.

20 O kuru ya, me ka ọ biakute nne-ya, ọ nọkwasi n’ikperè nne-ya rue etiti-ehihie, we nwua.

21 Ọ rigo, tọb͕ọ ya n’ihe-ndina onye nke Chineke ahu, mechibido ya uzọ, pua.

22 Ọ kpọ di-ya, si, Biko, ziterem otù nime umu-okorọbia, na otù nime nne-inyinya-ibu, ka m’we b͕akuru onye nke Chineke, lata kwa.

23 Ọ si, Gini mere gi onwe-gi nējekuru ya ta? ọ bughi ọnwa ọhu, ọ bughi kwa ubọchi-izu-ike. Ọ si, Udo.

24 O we jikwa inyinya-ibu, si nwa-okorọbia-ya, Nēdu, nēje kwa; eb͕ochilaram inyinya-ibu n’ibum b͕a ọsọ, ma ọ buru na asighm i.

25 O we je, biakute onye nke Chineke ahu, rue ugwu Kamel. O rue, mb͕e onye nke Chineke huru ya site na ncherita-iru ya, na ọ siri Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Le, nwayi Shunem ahu:

26 biko, b͕a ọsọ izute ya ub͕u a, si ya, Ì nọ n’udo? di-gi, ọ̀ nọ n’udo? nwa-gi, ọ̀ nọ n’udo? Ọ si, Ayi nọ n’udo.

27 O we biakute onye nke Chineke rue ugwu ahu, jide ya n’ukwu-ya abua. Gihezi we biarue nso inupu ya; ma onye nke Chineke siri, Ra ya aka: n’ihi na nkpuru-obi-ya di ilu nime ya; ma Jehova ezonariwom ya, O gosighkwam ya.

28 O we si, Àriọrọm nwa-nwoke n’aka onye-nwem? àsighm, Arafulam?

29 O we si Gihezi, Ke ihe-ọkiké n’úkwù-gi, were kwa nkpa-n’akam n’aka-gi, je: mb͕e i zutere nwoke ọ bula, ekelela ya; mb͕e nwoke ọ bula gēkele gi, azala ya: tukwasi nkpa-n’akam n’iru nwa-okoro ahu.

30 Nne nwa-okoro ahu we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m’gaghi-arapu gi ma-ọli. O we bilie, jeso ya.

31 Gihezi we gabiga n’iru ha, tukwasi nkpa-n’aka ahu n’iru nwa-okoro ahu; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di. O we jeghachi izute ya, gosi ya, si, Nwa-okoro ahu etetaghi.

32 Elaisha we bata n’ulo ahu, ma, le, nwa-okoro ahu anwuwo, atọb͕ọ-kwa-ra ya n’ihe-ndina-ya.

33 O we ba, mechibido ha abua uzọ kpere Jehova.

34 Ọ rigo, dina n’elu nwata ahu, tukwasi ọnu-ya n’ọnu-ya, na anya-ya abua n’anya-ya abua, na ọbu-aka-ya abua n’ọbu-aka-ya abua, ruru ala n’elu ya: anu-aru nwata ahu we di ọku.

35 O we biaghachi, jegharia iru na azu n’ulo otù ub͕ò; ọ rigo, ruru kwa n’elu ya: nwa-okoro ahu we ze uzere rue ub͕ò asa, nwa-okoro we saghe anya-ya abua.

36 Ọ kpọ Gihezi, si, Kpọ nwayi Shunem nka. Ọ kpọ ya. Nwayi ahu we bakute ya, ọ si, Kuru nwa-gi.

37 O we ba nime, da n’ala n’ukwu-ya, kpọ isi ala, kuru nwa-ya, pua.

38 Ma Elaisha biaghachiri rue Gilgal: ma oké unwu di n’ala ahu; umu ndi-amuma nānọdu kwa ala n’iru ya: o we si nwa-okorọbia-ya, Tukwasi ite uku n’ọku, siere umu ndi-amuma ofé.

39 Otù onye we pua ba n’ọhia ichikọta akwukwọ nri, ọ huta osisi vine ọhia, chikọta afufa-ọhia nime ya nju uwe-ya, bia, biye ha n’ite ofé: n’ihi na ha amaghi ha.

40 Ha we wuputara ndikom ahu, ka ha rie. O rue, mb͕e ha nēri ofé ahu, na ndi ahu tiri nkpu, si, Ọnwu di n’ite, gi onye nke Chineke. Ha apughi kwa iri ya.

41 O we si, Weta-kwa-nu utu ọka. O we tiye ya n’ite ahu, si, Wuputara ndi-ayi, ka ha we rie. Ihe ọjọ adighi kwa n’ite ahu.

42 Ma otù nwoke siri na Beal-shalisha bia, butere onye nke Chineke achicha nke nkpuru mbu, orú ob͕e achicha barley, na ọka nke ubi n’akpa-ya. Ọ we si, Nye ndi-ayi, ka ha we rie.

43 Onye nējere ya ozi we si, Gini, M’gēche nka n’iru ọgu ndikom ise? Ọ si, Nye ndi-ayi, ka ha we rie; n’ihi na otú a ka Jehova siri, Ha gēri, rifọ kwa.

44 O we che ya n’iru ha, ha we rie, rifọ kwa, dika okwu Jehova si di.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 5

1 Ma Neaman, bú onye-isi usu-ndi-agha eze Siria, bu nwoke di uku n’iru onye-nwe-ya, buru kwa onye anāhu iru-ọma, n’ihi na ọ bu n’aka-ya ka Jehova nyere Siria nzọputa: nwoke ahu bu kwa dike nke bu dìnkpà, ma ọ bu onye-ekpenta.

2 Ndi Siria apuwo nēje n’usu ndi nāpunara madu ihe, we si n’ala Israel dọta otù nwa-ob͕ọghọ ntà n’agha; o we nọ n’iru nwunye Neaman.

3 Ọ si nwayi-nwe-ya, Ọ gādim nọ̄ nma, ma asi na onye-nwem nọ n’iru onye-amuma nke nọ na Sameria! mb͕e ahu ọ gēme ka o si n’ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta.

4 Otù onye we ba, gosi onye-nwe-ya, si, Otú a na otú a ka nwa-ab͕ọghọ ahu nke sitere n’ala Israel kwuru.

5 Eze Siria we si, Je, ba, ka m’ziga-kwa-ra eze Israel akwukwọ. O we je, chiri n’aka-ya talent ọla-ọcha iri, na nnù ọla-edo iri-na-ise, na uwe nb͕anwe iri.

6 O were akwukwọ ahu biakute eze Israel, si, Ma ub͕u a, mb͕e akwukwọ a biakutere gi, le, ezìwom Neaman, bú orùm, biakute gi, ka i we me ka o si n’ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta.

7 O rue, mb͕e eze Israel guru akwukwọ ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu Chineke ka m’bu, ime ka madu nwua na ime ka madu di ndu, na nwoke a nēziterem ozi ime ka nwoke si n’ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta? ma otú ọ di, biko, maranu hu kwa na ya onwe-ya nāchọ uzọ isi megidem.

8 O rue, mb͕e Elaisha bú onye nke Chineke, nuru na eze Israel dọwara uwe-ya nile, o we zigara eze ozi, si, N’ìhi gini ka i dọwara uwe-gi nile? biko, ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n’Israel.

9 Neaman we bia, ya na inyinya-ya nile na ub͕ọ-ala-ya, o guzo n’ọnu-uzọ ulo Elaisha nwere.

10 Elaisha we zigara ya onye-ozi, si, Je, sa aru ub͕ò asa nime Jọdan, anu-aru-gi gālaghachikute kwa gi, i gādi kwa ọcha.

11 Ma Neaman were iwe, laba, si, Le, m’siri, Ọ ghaghi ipukutem, guzo, kpọkue aha Jehova, bú Chineke-ya, fufe aka-ya n’elu ebe ahu, me ka onye-ekpenta di ọcha soro ndi-ya zukọta.

12 Abana na Fapa, bú osimiri Damaskọs, hà adighi nma kari miri Israel nile? #m’gaghi-asa aru nime ha, di ọcha? O we chigharia, laba n’ọnuma.

13 Ndi-orù-ya we biarue nso, gwa ya okwu, si, Nnam, asi na ọ bu ihe uku onye-amuma gwara gi me, ì gaghi-eme ya? ì gēsi kwa aṅa ghara ime ya mb͕e ọ siri gi, Sa aru, di kwa ọcha?

14 O we rida, suye onwe-ya nime Jọdan ub͕ò asa, dika okwu onye nke Chineke si di: anu-aru-ya we laghachi dika anu-aru nwa-okoro ntà, o we di ọcha.

15 O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n’iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n’uwa nile, ọ bu nání n’Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n’aka orù-gi.

16 Ọ si, Jehova nādi ndu, Onye m’guzoworo n’iru Ya, m’gaghi-anara ihe ọ bula ma-ọli. O we rugide ya inara ya; ma ọ juru aju.

17 Neaman we si, Ọ buru na i naghi, biko, ka enye orù-gi ibu ájá nke inyinya mule abua gēbu; n’ihi na orù-gi agaghi-emere chi ọzọ àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ site n’ub͕u a, ma ọ bu náni Jehova.

18 Ka Jehova b͕aghara orù-gi ihe a; mb͕e onye-nwem nābà n’ulo Rimon ikpọ isi ala n’ebe ahu, mb͕e ya onwe-ya nādabere kwa n’akam, m’we kpọ isi ala n’ulo Rimon, mb͕e m’kpọrọ isi ala n’ulo Rimon, biko, ka Jehova b͕aghara orù-gi n’ihe a.

19 Ọ si ya, La n’udo. O we si n’ebe ọ nọ je n’uzọ-ya nwantī.

20 Ma Gihezi, bú nwa-okorọbia Elaisha onye nke Chineke, siri, Le, onye-nwem eb͕ochiwo onwe-ya n’ebe Neaman onye Siria nka nọ, n’ighara inara n’aka-ya ihe o wetara: Jehova nādi ndu, n’ezie m’gāb͕aso ya, nara ihe ufọdu n’aka-ya.

21 Gihezi we chuso Neaman. Neamam we hu otù onye nāb͕aso ya, o we si n’ub͕ọ-ala-ya rida izute ya, si, Ùdo di kwa?

22 Ọ si, Udo di. Onye-nwem ezitewom, si, Le, ọbuná ub͕u a umu-okorọbia abua nime umu ndi-amuma esiwo n’ugwu Efraim biakutem; biko, nye ha otù talent ọla-ọcha, na uwe nb͕anwe abua.

23 Neaman we si, Kwere, nara talent abua. O rugide ya, ke talent ọla-ọcha abua n’akpa abua, chiri uwe nb͕anwe abua, nye umu-okorọbia-ya abua; ha we būru ha ga n’iru ya.

24 Ọ biarue ugwu ntà ahu, nara ha n’aka-ha, tiye ha n ulo: o zilaga ndikom ahu, ha we la.

25 Ma ya onwe-ya bara nime, guzo n’akuku onye-nwe-ya. Elaisha we si ya, Òle ebe i si bia, Gihezi? Ọ si, Orù-gi ejeghi ebe ọ bula.

26 Ọ si ya, Òbim ejesoghi gi, mb͕e nwoke ahu siri n’ub͕ọ-ala-ya chigharia izute gi? ọ̀ bu mb͕e inara ego, na inara uwe, na ubi-olive na ubi-vine, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ndi-orù ndikom na ndinyom nēje ozi?

27 Ekpenta Neaman gārapara kwa n’aru gi, na n’aru nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi. Ọ we si n’iru ya pua, buru onye-ekpenta nēnwu dika snow.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 6

1 Umu ndi-amuma we si Elaisha, Biko, le, ebe ayi onwe-ayi nēbi n’iru gi adikara ayi nkpa.

2 Biko, ka ayi jerue Jọdan, si kwa n’ebe ahu were, nwoke ọ bula otù ntuhie, mere onwe-ayi otù ebe n’ebe ahu, ibiri n’ebe ahu. Ọ si, Jenu.

3 Otù onye we si, Biko, kwere, soro ndi-orù-gi je. Ọ si, Mu onwem gēje.

4 O we so ha je. Ha we biarue Jọdan, b͕utue osisi.

5 O rue, mb͕e otù onye nēb͕utu ntuhie-ya, na anyu-ike dabàra na miri: o we tie nkpu, si, Ewó, onye-nwem! nke ahu bu ihe ariọtara ariọta.

6 Onye nke Chineke we si, Òle ebe ọ dara? Ọ we me ka ọ hu ebe ahu. O we b͕utue otù osisi, tubà ya n’ebe ahu, me ka anyu-ike se n’elu miri.

7 O si, Weliere onwe-gi. O we setia aka-ya, were ya.

8 Ma eze Siria nēbuso Israel agha; o we me ka ndi-orù-ya dua ya ọdu, si, N’ebe di otú a otú a ka ọmuma-ulo-ikwūm gādi.

9 Onye nke Chineke we zigara eze Israel ozi, si, Lezie onwe-gi anya, ka i ghara igabiga ebe ahu; n’ihi na n’ebe ahu ka Siria nāridata.

10 Eze Israel we ziga ozi n’ebe ahu nke onye nke Chineke siri ya dọ kwa ya aka na nti bayere ya; ewe debe ya ndu n’ebe ahu, ọ bughi otù ub͕ò, ọ bughi kwa ub͕ò abua.

11 Ma obi eze Siria anọghi n’otù ebe n’ihi ihe a; o we kpọ ndi-orù-ya, si ha, Ùnu agaghi-egosim onye nime ayi diri eze Israel?

12 Otù onye nime ndi-orù-ya we si, É-è, onye-nwem eze: kama Elaisha, bú onye-amuma nke nọ n’Israel, o nēgosi eze Israel okwu nile nke i nēkwu n’ime-ulo-ndina-gi.

13 Ọ si, Jenu, hu ebe ya onwe-ya nọ, ka m’we ziga kuta ya. Ewe gosi ya, si, Le, ọ nọ na Dotan.

14 O we ziga inyinya na ub͕ọ-ala na oké usu-ndi-agha n’ebe ahu: ha we bia n’abali, je obodo ahu buruburu.

15 Onye nējere onye nke Chineke ozi we bilie n’isi-ututu, pua, ma, le, usu-ndi-agha nāb͕a obodo ahu buruburu, ha na inyinya na ub͕ọ-ala. Nwa-okorọbia-ya we si ya, Ewó, onye-nwem! àyi gēme aṅa?

16 Ọ si, Atula egwu: n’ihi na ndi ayi na ha nọ di ọtutu kari ndi ha na ha nọ.

17 Elaisha we kpe ekpere, si, Jehova, biko, saghe anya-ya abua, ka ọ we hu. Jehova we saghe anya nwa-okorọbia ahu; o we hu: ma, le, ugwu ahu juputara n’inyinya na ub͕ọ-ala ọku buruburu Elaisha.

18 Ha we ridakute ya, Elaisha we kpere Jehova, si, Biko, were ìsì tie mba nka. O we were ìsì tie ha dika okwu Elaisha si di.

19 Elaisha we si ha, Nka abughi uzọ, nka abughi kwa obodo; sonum je, m’gēme kwa ka unu jekuru nwoke ahu onye unu nāchọ. O we me ka ha je Sameria.

20 O rue, mb͕e ha bara na Sameria, na Elaisha siri, Jehova, saghe anya ndikom ndia, ka ha we hu. Jehova we saghe anya-la, ha we hu; ma, le, ha nọ n’etiti Sameria.

21 Eze Israel we si Elaisha, mb͕e ọ huru ha, Nnam, #m’gētib͕u ha? #m’gētib͕u ha?

22 Ọ si, Etib͕ula ha: ì gētib͕u ndi i wereworo mma-agha-gi, were kwa uta-gi, dọta n’agha? dọba nri na miri n’iru ha, ka ha we rie, ṅu kwa, lakuru onye-nwe-ha.

23 O we mere ha oké oriri: ha we rie, ṅu kwa, o we zilaga ha, ha we lakuru onye-nwe-ha. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria abataghi ọzọ n’ala Israel.

24 O rue, mb͕e nka gasiri, na Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, rigo, nọchigide Sameria n’agha.

25 Oké unwu uku we di na Sameria: ma, le, ha nānọchigide ya n’agha, rue mb͕e anēre isi inyinya-ibu ọgu ọla-ọcha anọ na otù uzọ n’uzọ anọ nke otù kab ǹsí nduru ọla-ọcha ise.

26 O rue, mb͕e eze Israel nāgabiga n’elu mb͕idi, na otù nwayi tikuru ya nkpu, si, Zọputa, onye-nwem eze.

27 Ọ si, Ọ buru na Jehova azọputaghi gi, òle ebe m’gēsi zọputa gi? ọ̀ bu site n’ebe-nzọcha-ọka, ma-ọbu site n’ebe-nzọcha-nkpuru-vine?

28 Eze we si ya, Gini nēme gi? Ọ si, Nwayi a sirim, Nye nwa-gi nwoke, ka ayi we rie ya ta, nwam nwoke ka ayi gēri kwa echi.

29 Ayi we sie nwam nwoke, rie ya: m’we si ya n’ubọchi soro ya, Nye nwa-gi nwoke, ka ayi we rie ya: ma o zowo nwa-ya nwoke.

30 O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke nwayi ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile; (ma ya onwe-ya nāgabiga n’elu mb͕idi;) ndi Israel we le anya, ma, le, ákwà-nkpe dikwasi n’anu-aru-ya n’okpuru uwe-ya.

31 O we si, Ka Chineke mem otú a, ka O me kwa ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na isi Elaisha nwa Shefat gēguzo n’aru ya ta.

32 Ma Elaisha nānọdu n’ulo-ya, ndi-okenye nānọdu kwa n’ebe ọ nọ: eze we ziga otù nwoke site n’iru ya: ma tutu onye-ozi ahu abiakute ya, ya onwe-ya siri ndi-okenye, Ùnu ahuwo na nwa ob͕u-madu a ezitewo iwezuga isim? hunu, mb͕e onye-ozi ahu nābia, mechienu uzọ, were ibo-uzọ kwagide ya: òlu ukwu abua nke onye-nwe-ya adighi n’azu ya?

33 Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, le, onye-ozi ahu nāridakuru ya: ọ si, Le, ihe ọjọ a sitere n’aka Jehova; gini mere m’nēle anya Jehova ọzọ?

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 7

1 Elaisha we si, Nurunu okwu Jehova: otú a ka Jehova siri, Dika mb͕e a echi agēre otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, n’ọnu-uzọ-ama Sameria.

2 Ọchi-agha ahu onye eze nwere, onye ọ nādabere n’aka-ya, we za onye nke Chineke, si, Le, ọ buru na Jehova eme window n’elu-igwe, ihe a, ọ̀ gādi? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya.

3 Ma ndikom anọ, bú ndi-ekpenta, nọ n’oghere ọnu-uzọ-ama: ha we sirita, onwe-ha, Gini mere ayi onwe-ayi nānọdu n’ebe a rue mb͕e ayi nwuru?

4 Ọ buru na ayi asi, Ayi gābà n’obodo, oké unwu di kwa n’obodo, ayi gānwu kwa n’ebe ahu: ọ buru kwa na ayi anọdu n’ebe a, ayi gānwu kwa. Ma ub͕u a, bianu, ka ayi dabà n’ọmuma-ulo-ikwū Siria: ọ buru na ha edebe ayi ndu, ayi gādi ndu; ọ buru kwa na ha eme ka ayi nwua, ayi gānwu kwa.

5 Ha we bilie n’ururuchi, ibà n’ọmuma-ulo-ikwū Siria: ha we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n’ebe ahu.

6 N’ihi na Onwe-nwe-ayi mere ọmuma-ulo-ikwū Siria ka ha nu olu ub͕ọ-ala, na olu inyinya, bú olu oké usu-ndi-agha: ha we sirita onwe-ha, Le, eze Israel egowo ndi-eze ndi Het, na ndi-eze Ijipt, imegide ayi, ibiakwasi ayi.

7 Ha we bilie, b͕alaga n’ururuchi, rapu ulo-ikwū nile ha, na inyinya nile ha, na inyinya-ibu nile ha, ọbuná ọmuma-ulo-ikwū-ha otú di, b͕alaga n’ihi ndu-ha.

8 Ndi-ekpenta ahu we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū, ba n’otù ulo-ikwū, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si n’ebe ahu chiri ọla-ọcha, na ọla-ebo, na uwe, je zo ha; ha we biaghachi, ba n’ulo-ikwū ọzọ, si n’ebe ahu chiri kwa ihe, je zo ha.

9 Ha we sirita onwe-ha, Ọ bughi ihe ziri ezi ka ayi onwe-ayi nēme: ubọchi ta, ubọchi ozi ọma ka ọ bu, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti: ọ buru na ayi echere rue ìhè ututu, ajọ omume-ayi gāchọputa ayi: ma ub͕u a bianu, ka ayi ba gosi ulo eze.

10 Ha we bia, kpọ onye-ọnu-uzọ-ama obodo òkù, gosi ha, si, Ayi bara n’ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n’ebe ahu, ọ dighi kwa olu madu di, ma inyinya elibere elibe, na inyinya-ibu elibere elibe, na ulo-ikwū otú ha di.

11 O we kpọ ndi-ọnu-uzọ-ama; ha we gosi ya ulo eze nime.

12 Eze we bilie n’abali, si ndi-orù-ya, Biko, ka m’gosi unu ihe Siria meworo ayi. Ha mara na agu nāgu ayi onwe-ayi, ha we si n’ọmuma-ulo-ikwū-ha pua izo onwe-ha n’ọhia, si, Mb͕e ha siri n’obodo puta, ayi gējide ha na ndu, ba n’obodo-ha.

13 Otù nime ndi-orù-ya we za, si, Biko, ka achiri inyinya ise nime inyinya fọduru, nke fọduru nime ya, (le, ha di ka ìgwè nile nke Israel nke fọduru nime ya; le, ha di ka ìgwè nile nke Israel ndi gwusiri agwusi:) ka ayi ziga hu kwa.

14 Ha we chiri ub͕ọ-ala abua, ha na inyinya; eze we ziga ha iso ọmuma-ulo-ikwū Siria, si, Jenu, hu.

15 Ha we jeso ha rue Jọdan: ma, le, uzọ nile juputara n’uwe na ihe, nke ndi Siria tufuru n’ime-ngwa-ngwa-ha. Ndi-ozi we lata, gosi eze.

16 Ndi Israel we pua, luta ọmuma-ulo-ikwū Siria n’agha. Ewe re otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, dika okwu Jehova si di.

17 Eze we me ka onye-isi-agha ahu, bú onye ọ nādabere n’aka-ya, lekọta ọnu-uzọ-ama: ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n’ọnu-uzọ-ama, ọ nwua dika onye nke Chineke kwuru, onye kwuru mb͕e eze ridakuru ya.

18 O rue, dika onye nke chineke gwara eze okwu, si, Agēre mb͕é barley abua otù shekel, na otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, dika mb͕è a echi, n’ọnu-uzọ-ama Sameria;

19 onye-isi-agha we za onye nke Chineke, si, Ma, le, ọ buru na Jehova eme window n’elu-igwe, ọ̀ gādi ka okwu a si di? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya:

20 o we diri ya otú a; ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n’ọnu-uzọ-ama, ọ nwua.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 8

1 Ma Elaisha gwara nwayi ahu okwu, bú onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu, si, Bilie, je, gi onwe-gi na ulo-gi, nọ dika ọbìa n’ebe ọ bula i gānọ dika ọbìa: n’ihi na Jehova akpọwo oké unwu ka ọ da: ọzọ kwa, ọ gābiakwasi ala arọ asa.

2 Nwayi ahu we bilie, me dika okwu onye nke Chineke si di: ọ we je, ya onwe-ya na ulo-ya, nọ dika ọbìa n’ala ndi Filistia arọ asa.

3 O rue, n’ọgwugwu arọ asa ahu, na nwayi ahu si n’ala ndi Filistia lata: ọ pua itiku eze nkpu bayere ulo-ya na ala-ya.

4 Ma eze nāgwa Gihezi, bú nwa-okorọbia onye nke Chineke, okwu, si, Biko, kọrọm akukọ ihe uku nile nke Elaisha meworo.

5 O rue na, mb͕e ya onwe-ya nākọrọ eze otú o mere ka onye nwuru anwu di ndu ọzọ, le, nwayi ahu, onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu ọzọ nētiku eze nkpu bayere ulo-ya, baye-kwa-ra ala-ya. Gihezi we si, Onye-nwem eze, nka bu nwayi ahu, nka bu kwa nwa-ya nwoke, onye Elaisha mere ka ọ di ndu ọzọ.

6 Eze we jua nwayi ahu, o we kọrọ ya akukọ ahu. Eze we nye ya otù onye nējere ya ozi, si, Nyeghachi ihe nile o nwere, na ihe-ọmume nile nke ubi site n’ubọchi ọ rapuru ala-ya, we rue ub͕u a.

7 Elaisha we biarue Damaskọs; ma Ben-hedad, bú eze Siria, nāria ọria; ewe gosi ya, si, Onye nke Chineke abiawo n’ebe a.

8 Eze we si Hazael, Were onyinye-inata-iru-ọma n’aka-gi, je izute onye nke Chineke, jua Jehova ase site n’aka-ya, si, M’gādiri ndu n’ọria nka?

9 Hazael we je izute ya, were onyinye-inata-iru-ọma n’aka-ya, bú ezi ihe nile nke Damaskọs, ibu ọgu camel abua gēbu, o we bia guzo n’iru ya, si, Nwa-gi, bú Ben-hedad eze Siria, ezìwom biakute gi, si, M’gādiri n’ọria nka?

10 Elaisha we si ya, Je, si ya, I ghaghi idiri ndu; ma Jehova emewo ka m’hu na ọ ghaghi inwu.

11 Ọ we legide ya anya, che ya iru, rue mb͕e ihere mere ya: onye nke Chineke we kwa ákwá.

12 Hazael we si, Gini mere onye-nwem nākwa ákwá? Ọ si, N’ihi na amawom ihe ọjọ nke i gēme umu Israel: i gēsu ebe nile ha ewusiri ike ọku, i gēwere kwa mma-agha b͕ue umu-okorobia-ha, i gātupia kwa umu-ha nāṅu ara, i gāb͕awa ndinyom-ha di ime afọ.

13 Hazael we si, Ma gini bu orù-gi, bú nkita nka, na ọ gēme ihe uku a? Elaisha we si, Jehova emewo ka m’hu na i gābu eze Siria.

14 O we si n’ebe Elaisha nọ la, biakute onye-nwe-ya; ọ si ya, Gini ka Elaisha siri gi? Ọ si, Ọ sirim na i ghaghi idiri ndu.

15 O rue, n’echi-ya, na ọ chiri ákwà-ob͕ub͕o, biaye na miri, b͕asa ya n’iru-ya, ọ we nwua: Hazael we buru eze n’ọnọdu ya.

16 Ma n’arọ nke-ise nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, mb͕e Jehoshafat bu kwa eze Juda, Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda, malitere ibu eze.

17 Orú arọ na iri na abua ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ astọ na Jerusalem.

18 Ọ je ije n’uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n’ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka o nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.

19 Ma Jehova ekweghi ibibi Juda, n’ihi Devid, bú orù-Ya, dika Ọ siri ya na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.

20 N’ubọchi-ya ka Edom siri n’okpuru aka Juda jehie, mere onwe-ha eze.

21 Joram we gabiga rue Zaia, ya na ub͕ọ-ala-ya nile: o rue na o biliri n’abali, tib͕ue Edom ndi nāb͕a ya buruburu, ha na ndi-isi ub͕ọ-ala: ndi ahu we b͕alaga n’ulo-ikwū-ha.

22 Edom we si n’okpuru aka Juda jehie, rue ta. Mb͕e ahu ka Libna jehiere n’otù mb͕e ahu.

23 Ma okwu Joram nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

24 Joram we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Devid: Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n’ọnọdu ya.

25 N’arọ nke-iri-na-abua nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, ka Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, malitere ibu eze.

26 Orú arọ na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem. Ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri, bú eze Israel.

27 O we je ije n’uzọ ulo Ehab, me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n’ihi na nwa nwa ulo Ehab ka ọ bu.

28 O we soro Joram nwa Ehab ibuso Hazael, bú eze Siria, agha na Remot-gilead: ndi Siria we tib͕ue Joram.

29 Eze, bú Joram, we lata ka agwọ ya nime Jezreel na ntib͕u ndi Siria tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Joram nwa Ehab nime Jezreel, n’ihi na ọ nāria ọria.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 9

1 Ma Elaisha, bú onye-amuma, kpọrọ otù onye nime umu ndi-amuma, si ya, Ke ihe-ọkiké n’úkwù-gi, were karama manu a n’aka-gi, je Remot-gilead.

2 Mb͕e i biara ebe ahu, gi hu Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi anya n’ebe ahu, ba nime, me ka o bilie site n’etiti umu-nne-ya, me kwa ka ọ ba n’ime-ulo di n’ime-ulo.

3 Gi were kwa karama manu ahu, wukwasi ya n’isi-ya, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel. Meghe kwa uzọ, b͕alaga, eche-kwa-la eche.

4 Nwa-okorọbia ahu, ọbuná nwa-okorọbia ahu, bú onye-amuma, we jerue Remot-gilead.

5 Ọ bia, ma, le, ndi-isi usu-ndi-agha nanọdu ala; ọ si, Enwerem okwu igwa gi, onye-isi. Jihu we si, Ọ̀ bu onye nime ayi nile? Ọ si, Ọ bu gi, onye-isi.

6 O bilie, ba n’ulo; ọ wukwasi manu ahu n’isi-ya, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Etewom i manu ibu eze ndi Jehova, bú Israel.

7 I gētib͕u kwa ulo Ehab, bú onye-nwe-gi, ka M’we bọ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orùm, bú ndi-amuma, na ọbara ndi-orù nile nke Jehova, n’aka Jezebel.

8 Ulo nile nke Ehab gāla kwa n’iyì: M’gēbipu kwa n’aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n’Israel.

9 M’gēme kwa ulo Ehab ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija.

10 Nkita gēri kwa Jezebel n’òkè-ala-ubi Jezreel, ọ dighi kwa onye nēlì ya. O we meghe uzọ b͕alaga.

11 Jehu we pukute ndi-orù onye-nwe-ya: otù onye we si ya, Ùdo di kwa? gini mere onye a nke nāwi ara biakutere gi? Ọ si ha, Unu onwe-unu amawo nwoke ahu na nkpari-uka-ya.

12 Ha si, Ọ bu okwu-ugha; biko, gosi ayi. Ọ si, Otú a na otú a ka ọ gwaram, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel.

13 Ha we me ngwa, chiri, nwoke ọ bula uwe-ya, do ya n’okpuru ya n’elu ihe-nrigo, fùa opì-ike, si, Jihù bu eze.

14 Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi we kekọta madu imegide Joram. (Ma Joram nēche Remot-gilead, ya onwe-ya na Israel nile, n’ihi Hazael, bú eze Siria:

15 ma Jehoram, bú eze, laghachiri ka agwọ ya nime Jezreel na ntib͕u nke ndi Siria tib͕uru ya, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha.) Jihu we si, Ọ buru na nka bu uche-unu, ka onye-nb͕apu ghara isi n’obodo a pua ije igosi ya nime Jezreel.

16 Jihu we nọdu n’ub͕ọ-ala, jerue Jezreel; n’ihi na Joram nēdina n’ebe ahu. Ma Ehazaia, bú eze Juda, ridatara ihu Joram.

17 Ma onye-nche nēguzo n’elu ulo-elu na Jezreel, ọ hu ìgwè ndi Jihu mb͕e ọ nābia, ọ si, Ìgwè madu ka m’nāhu. Jehoram we si, Were onye-inyinya, ziga izute ha, ya si kwa, Ùdo di kwa?

18 Onye-nnọkwasi-inyinya we je izute ya, si, Otú a ka eze siri. Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n’azum. Onye-nche ahu we gosi, si, Onye-ozi-ayi biakutere ha, ma ọ lataghi.

19 O we zipu onye-nnọkwasi-inyinya nke-abua, ọ biakute ha, si, Otú a ka eze siri, Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n’azum.

20 Onye-nche we gosi, si, Ọ biaruru ha aru, ma ọ latagh: ma odudu-inyinya di ka odudu-inyinya Jihu nwa Nimshi; n’ihi na o nēdu inyinya dika onye nāwi ara.

21 Jehoram we si, Jikwa ub͕ọ-ala. Ha we jikwa ub͕ọ-ala-ya. Jehoram, bú eze Israel, na Ehazaia, bú eze Juda, we pua, nwoke ọ bula n’ub͕ọ-ala-ya, ha we pua izute Jihu, we huta ya n’òkè-ala-ubi Nebot, bú onye Jezreel.

22 O rue, mb͕e Jehoram huru Jihu, na ọ siri, Ùdo di kwa, Jihu? Ọ si, Gini bu udo ahu, na mb͕e ikwa-iko Jezebel, bú nne-gi, na mb͕asi-ya nādi ọtutu?

23 Jehoram we chigharia aka-ya abua, b͕alaga, si Ehazaia, Aghughọ di, Ehazaia.

24 Jihu we dọtia uta-ya ka aka-ya ra, b͕ata Jehoram n’ab͕ata ogwe-aka-ya abua, àkú we si n’obi-ya puta, o we ruru ala n’ub͕ọ-ala-ya.

25 Jihu we si Bidka, bú onye-isi-agha-ya, Bulie ya, tubà n’òkè ubi Nebot, bú onye Jezreel: n’ihi na cheta na mu na gi nānọkwasi n’elu inyinya, ayi abua, nēso Ehab, bú nna-ya, mb͕e Jehova boro ya ibu a;

26 N’ezie ahuwom ọbara Nebot na ọbara umu-ya ndikom n’abali hnyahuru, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta; M’gākwughachi kwa gi n’òkè-ala-ubi nka, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta. Ma ub͕u a bulie ya, tubà ya n’òkè-ala-ubi ahu, dika okwu Jehova si di.

27 Ma Ehazaia, bú eze Juda, huru ya, b͕alaga n’uzọ ulo ubi ab͕ara ogige. Jihu we chuso ya, si, Tib͕u-kwa-nu ya n’ub͕ọ-ala-ya. Ha we tib͕ue ya na nrigo Gua, nke di nso Ibleam. O we b͕alaga na Megido, nwua n’ebe ahu.

28 Ndi-orù-ya we me ka ub͕ọ-ala-ya būru ya jerue Jerusalem, ha we lìe ya n’ílì-ya, n’ebe elìri nna-ya-hà, n’obodo Devid.

29 Ma n’arọ nke-iri-na-otù nke Joram nwa Ehab ka Ehazaia malitere ibu eze Juda.

30 Jihu we biarue Jezreel, Jezebel we nu ya; ọ we de ihe-ichọ-nma n’anya-ya abua, me ka isi-ya di nma, lepu anya na window.

31 Mb͕e Jihu bara n’ọnu-uzọ-ama, nwayi ahu siri, Ùdo di kwa, Zimri, ob͕u onye-nwe-ya?

32 Jihu we welie iru-ya le anya na window, si, Ònye diyerem? ònye? Onozi abua ma-ọbu atọ we leputa anya n’ebe ọ nọ.

33 Ọ si, Tudanu ya. Ha we tuda ya: ufọdu nime ọbara-ya we fesa na mb͕idi, na n’inyinya-ya: ọ we zọkwasi ya ukwu.

34 Ọ bata, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si, Biko, Lenu nwayi a aburu ọnu anya nke-ọma, lìe ya: n’ihi na nwa-nwayi eze ka ọ bu.

35 Ha we je ilì ya: ma ha achọtaghi ihe ọ bula di n’aru-ya ma-ọbughi okpokoro-isi-ya, na ukwu-ya abua, na ọbu-aka-ya abua.

36 Ha we biaghachi, gosi ya. Ọ si, Okwu Jehova ka ọ bu, nke O kwuru n’aka orù-Ya, bú Elaija onye Tisbe, si, N’òkè-ala-ubi Jezreel ka nkita gēri anu-aru Jezebel:

37 ozu Jezebel gādi kwa ka ǹsí-anu n’elu ubi n’òkè-ala-ubi Jezreel; ha ewe ghara isi, Nka bu Jezebel.

Categories
II. NDI-EZE

II. NDI-EZE 10

1 Ma Ehab nwere ọgu umu-ndikom atọ na iri nime Sameria. Jihu we de akwukwọ ziga na Sameria, zigara ndi-isi Jezreel, bú ndi-okenye, ziga-kwa-ra ndi nāzù umu Ehab, si,

2 Ma ub͕u a, mb͕e akwukwọ a bara n’aka-unu, ebe umu onye-nwe-unu nọ n’etiti unu, ebe ub͕ọ-ala na inyinya di kwa n’etiti unu, na obodo ewusiri ike, na ihe-agha;

3 leputanu onye ahu nke kachasi nma, nke zi-kwa-ra ezi karisia, nime umu-ndikom onye-nwe-unu, donu ya n’elu oche-eze nna-ya, buere ulo onye-nwe-unu agha.

4 Ha we tua egwu nke-uku ri nne, si, Le, eze abua eguzoghi n’iru ya: àyi onwe-ayi gēsi kwa aṅa guzo?

5 Onye nke bu onye-isi ulo, na onye nke bu onye-isi obodo, na ndi-okenye, na ndi nāzù umu eze, we zigara Jihu ozi, si, Ndi-orù-gi ka ayi bu, ayi gēme kwa ihe nile i si ayi me; ayi agaghi-eme nwoke ọ bula eze: gi me ihe di nma n’anya-gi.

6 O we degara ha akwukwọ nke ub͕ò abua, si, Ọ buru na mu ka unu diri, ọ buru kwa na olum ka unu onwe-unu nēge nti, chirinu isi ndikom ahu, bú umu onye-nwe-unu, biakutem dika mb͕e a echi rue Jezreel. Ma umu eze, bú ọgu ndikom atọ na iri, nọ n’aka ndi uku obodo ahu, ndi nāzùlite ha.

7 O rue, mb͕e akwukwọ ahu bara ha n’aka, na ha chiri umu eze, b͕ue ha, bú ọgu ndikom atọ na iri, tiye isi-ha nime nkata, zigara ya rue Jezreel.

8 Onye-ozi we bia, gosi ya, si, Ha ebubatawo isi umu eze. Ọ si, Tukọbanu ha n’obo abua n’oghere ọnu-uzọ-ama rue ututu.

9 O rue, n’ututu, na ọ puru, guzo, si ndi Israel nile, Ndi ezi omume ka unu bu: le, mu onwem kekọtara madu imegide onye-nwem, b͕ue ya: ma ònye tib͕uru ndia nile?

10 Maranu ub͕u a na ọ dighi okwu ọ bula gāda n’ala nime okwu Jehova, nke Jehova kwuru bayere ulo Ehab: n’ihi na Jehova emewo ihe O kwuru n’aka orù-Ya, bú Elaija.

11 Jihu we tib͕ue ndi nile fọduru ulo Ehab nime Jezreel, na ndi uku ya nile, na ndi ọ mara nke-ọma, na ndi-nchu-àjà-ya, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ọ rapuru ya.

12 O bilie, bia, jerue Sameria. Mb͕e ya onwe-ya ruru ulo-nlibe-anu nke ndi-ọzùzù-aturu n’uzọ,

13 Jihu hutara umu-nne Ehazaia, bú eze Juda, ọ si, Òle ndi ka unu bu? Ha si, Umu-nne Ehazaia ka ayi bu: ayi nārida kwa iju ajuju bayere udo umu eze na umu eze-nwayi.

14 Ọ si, Jidenu ha na ndu. Ha we jide ha na ndu, b͕ue ha n’olùlù ulo-nlibe-anu, bú ọgu ndikom abua na abua; o kweghi kwa ka nwoke ọ bula fọdu nime ha.

15 O si n’ebe ahu je, we huta Jehonadab nwa Rikab, ka ọ nābia izute ya: ọ gọzie ya, si ya, Obi-gi, ò ziri ezi, dika obim di n’ebe obi-gi di? Jehonadab we si, Otú a ka ọ di. Ọ buru na ọ di otú a, nyem aka-gi. O we nye ya aka-ya; o we me ka ọ rigo n’ub͕ọ-ala-ya.

16 Ọ si, Jesom, le ekworo m’nēkworo Jehova. Ha we me ka ọ ga ije n’ub͕ọ-ala-ya.

17 Ọ biarue Sameria, tib͕ue ndi nile fọduru Ehab nime Sameria, rue mb͕e o kpochapuru ya, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara Elaija.

18 Jihu we chikọta ndi Israel nile, si ha, Ehab fère Beal òfùfè nke-ntà; Jihu gēfè ya òfùfè rinne.

19 Ma ub͕u a, kpọnu ndi-amuma nile nke Beal, na ndi nile nēfè ya, na ndi-nchu-àjà-ya nile, ka ha biakutem; ka aghara ile anya nwoke ọ bula ma ahughi ya: n’ihi na enwerem àjà uku ichuru Beal; onye ọ bula elere anya ya ma ahughi ya, ọ gaghi-adi ndu. Ma Jihu mere ya n’aghughọ, ka o we me ka ndi nēfè Beal la n’iyì.

20 Jihu we si, Donu ubọchi nb͕ochi nsọ nye Beal. Ha we kpọsa ya.

21 Jihu we ziga ozi n’Israel nile: ndi nile nēfè Beal we bia, ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nke nābiaghi. Ha we ba n’ulo Beal; ulo Beal we juputa na madu site n’otù ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ.

22 Ọ si onye ahu nke bu onye-isi ulo anēdebe uwe, Chiputara ndi nile nēfè Beal uwe. O we chiputara ha uwe.

23 Jihu we ba, ya na Jehonadab nwa Rikab, n’ulo Beal; ọ si ndi nēfè Beal, Chọsienu ike, hu, ka otù nime ndi nēfè Jehova ghara idi n’ebe a n’etiti unu, kama ndi nēfè Beal, nání ha.

24 Ha we ba ime àjà na àjà-nsure-ọku. Ma Jihu doro nye onwe-ya ọgu ndikom anọ n’èzí, si, Nwoke ahu nke kwere ka otù onye wepuga onwe-ya nime ndikom ahu ndi mu onwem nēme ka ha ba n’aka-unu, ndu-ya gālara ndu-ya.

25 O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku, na Jihu siri ndi-ọb͕a-ọsọ, si kwa ndi-isi-agha, Banu, tib͕ue ha; ekwela nwoke ọ bula pua. Ha we were ọnu mma-agha tib͕ue ha; ndi-ọb͕a-ọsọ na ndi-isi-agha tupuru ha n’èzí, jerue obodo ulo Beal.

26 Ha we buputa ogidi nke ulo Beal, sure ha ọku.

27 Ha kwatu-kwa-ra ogidi Beal, kwatu kwa Beal, me ka ọ buru olùlù-ọkwu, rue ta.

28 Jihu we kpochapu Beal n’Israel.

29 Nání nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie, Jihu ewezugaghi onwe-ya n’iso ha, bú umu-ehi ọla-edo ahu nke di na Bet-el, na nke di na Dan.

30 Jehova we si Jihu, N’ihi na i mewo nke-ọma n’ime ihe ziri ezi n’anyam, i we me ulo Ehab dika ihe nile si di nke di n’obim, umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n’oche-eze Israel.

31 Ma Jihu elezighi anya ijeghari n’iwu Jehova, bú Chineke Israel, n’obi-ya nile: o wezugaghi onwe-ya pua na nmehie nile nke Jeroboam, nke o jiri me ka Israel mehie.

32 Na mb͕e ahu ka Jehova malitere ibipu ufọdu n’Israel: Hazael we tib͕ue ha n’ókè ala nile nke Israel;

33 site na Jọdan n’ọwuwa-anyanwu, ala nile nke Gilead, ndi Gad, na ndi Reuben, na ndi Manase, site n’Aroea, nke di n’akuku ndagwurugwu Anon, bú Gilead na Beshan.

34 Ma okwu Jihu nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya nile, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

35 Jihu we so nna-ya-hà dina n’ọnwu: ha we lìe ya na Sameria. Jehoahaz nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

36 Ma ubọchi Jihu bu eze Israel nime Sameria di orú arọ na asatọ.