Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 31

1 Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n’ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n’Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n’ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha.

2 Hezekaia we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, dika òkè nile ha si di, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di, ma ndi-nchu-àjà ma ndi Livai, ichu àjà-nsure-ọku na àjà-udo, ije ozi, na ikele ekele, na ito Chineke n’ọnu-uzọ-ama nile nke ọmuma-ulo-ikwū Jehova.

3 O guzo-kwa-ra òkè eze sitere n’àkù-ya iji chu àjà-nsure-ọku, bú àjà-nsure-ọku nke ututu na nke anyasi, na àjà-nsure-ọku anāchu n’ubọchi-izu-ike nile, na nke anāchu n’ọnwa ọhu nile, na nke anāchu na mb͕e nile akara àkà, dika edeworo ya n’iwu Jehova.

4 O we si ndi Juda, bú ndi bi na Jerusalem, ka ha nye òkè ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ka ha we di ike n’iwu Jehova.

5 Ma mb͕e ekwusara okwu ahu, umu Israel nyere nkpuru mbu nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, na nke manu-aṅu, na nke ihe-ọmume nile nke ubi, n’uba; otù uzọ n’uzọ iri nke ihe nile ka ha bubatara n’uba.

6 Umu Israel na Juda, ndi bi n’obodo Juda nile, ndi ahu bubata-kwa-ra otù uzọ n’uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, na otù uzọ n’uzọ iri nke ihe nsọ nke edoro nsọ nye Jehova, bú Chineke-ha, ha we tinye aha n’obo n’obo.

7 N’ọnwa nke-atọ ka ha malitere itọ ntọ-ala nke obo ahu, n’ọnwa nke-asa ka ha tubìri ha.

8 Hezekaia na ndi-isi we bia hu obo nile, gọzie Jehova, na ndi-Ya, bú Israel.

9 Hezekaia we jua ndi-nchu-àjà na ndi Livai ajuju bayere obo ahu.

10 Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, nke ulo Zedok, we gwa ya, si, Site na mb͕e ha malitere ibubata àjà-nbuli n’ulo Jehova, ayi erijuwo afọ, rifọ kwa ihe n’uba: n’ihi na Jehova agọziwo ndi-Ya; ma nke fọduru bu ọtutu ihe nile a.

11 Hezekaia we si ka edozie ime-ulo n’ulo Jehova; ha we dozie.

12 Ha we bubata àjà-nbuli, na otù uzọ n’uzọ iri, na ihe nsọ nile, n’ikwesi-ntukwasi-obi: ma otù onye-ndú nāchi ha bu Konanaia onye Livai, Shimai nwa-nne-ya bu kwa nke-abua.

13 Na Jehiel, na Azazaia, na Nehat, na Asahel, na Jerimot, na Jozabad, na Eliel, na Ismakia, na Mehat, na Benaia, bú ndi-nlekọta n’okpuru aka Konanaia na Shimai nwa-nne-ya, site n’otú Hezekaia, bú eze, na Azaraia, bú onye-ndú ulo Chineke, mere ha ndi-nlekọta.

14 Kore nwa Imna, bú onye Livai, onye-ọnu-uzọ-ama n’akuku ọwuwa-anyanwu, bu onye-isi onyinye-afọ-ofufo Chineke, inye àjà-nbuli Jehova na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile.

15 Iden, na Miniamin, na Jeshua, na Shemaia, na Amaraia, na Shekanaia, nọ kwa n’aka-ya, n’obodo ndi-nchu-àjà, n’ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, inye umu-nne-ha ihe n’òkè, bú inye onye ntà otú anēnye onye uku:

16 nāgughi ndi di n’akwukwọ-osuso-ọmumu-ha nke ndikom, site na ndi b͕ara arọ atọ we ga n’iru, bú onye ọ bula nke nābà n’ulo Jehova, ilu ọlu ubọchi n’ubọchi-ya, ifè òfùfè-ha n’ihe-ndebe nile ha dika òkè nile ha si di;

17 na ndi di n’akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi-nchu-àjà dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ndi Livai site na ndi b͕ara orú arọ we ga n’iru, n’ihe-ndebe nile ha n’òkè nile ha;

18 na ndi di n’akwukwọ-osuso-ọmumu n’etiti umu-ntakiri-ha nile, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom, nime nkpọkọta Israel nile: n’ihi na n’ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, ka ha doro onwe-ha nsọ n’idi-nsọ:

19 umu Eron kwa, bú ndi-nchu-àjà, ndi nọ n’ọhia nke ebe-ita-nri obodo-ha, n’obodo nile ọ bula, ha nwere ndikom ndi akpọrọ n’aha n’aha, inye ndikom nile n’etiti ndi-nchu-àjà òkè-ha, inye kwa ndi nile ndi di n’akwụkwọ-osuso-ọmumu n’etiti ndi Livai.

20 Hezekaia we me otú a nime Juda nile; o we me ezi ihe na nke ziri ezi na ezi-okwu n’iru Jehova, bú Chineke-ya.

21 Ma n’ọlu ọ bula nke ọ malitere n’òfùfè nke ulo Chineke, na n’iwu, na n’ihe nile enyere n’iwu, ichọ Chineke, ọ bu obi-ya nile ka o ji me ya, ihe we gara ya nke-ọma.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 32

1 Mb͕e ihe ndia na ezi-okwu a gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, biara, ba nime Juda, we ma ulo-ikwū-ya imegide obodo nile ewusiri ike, si na o gētipú ha nye onwe-ya.

2 Hezekaia we hu na Senakerib abiawo, che iru ibuso Jerusalem agha,

3 o we me ndi-isi-ya na ndi-dike-ya ka ha dua ya ọdu, ib͕ochi miri nke isi-iyi nile nke di n’azu obodo; ha we yere ya aka.

4 Ewe chikọta ndi di ọtutu, ha we b͕ochie isi-iyi nile, na miri-iyi ahu nke nērùsi ike n’etiti ala-ha, si, N’ìhi gini ka ndi-eze Asiria gābia, hu ọtutu miri?

5 O we me onwe-ya ka ọ di ike, we wuzie mb͕idi nile nke etipúru etipú, o we wulie ya rue ulo-elu-ya nile, wu kwa mb͕idi ọzọ n’azu, me ka Milo, nke di n’obodo Devid, di ike, o me-kwa-ra ihe-agha na ọta n’uba.

6 O we do ndi-ọchi-agha ka ha buru ndi-isi ndi-ya, o we chikọta ha n’ebe ọ nọ n’amá nke ọnu-uzọ-ama obodo, gwa ha okwu nābà n’obi-ha, si,

7 Dinu ike nwe kwa ume, unu atula egwu atu-kwa-la ujọ n’ihi eze Asiria, ma-ọbu n’ihi ìgwè ahu nile nke nọyere ya: n’ihi na nke nọyere ayi di ọtutu kari nke nọyere ya:

8 nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n’elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda.

9 Mb͕e nka gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, zigara ndi-orù-ya na Jerusalem, (ma ya onwe-ya nānọchigide Lekish n’agha, ya na ndi nile ọ nāchi,) jekuru Hezekaia, bú eze Juda, jekuru kwa Juda nile ndi nọ na Jerusalem, si,

10 Otú a ka Senakerib, bú eze Asiria, siri, N’ìhe gini ka unu onwe-unu nātukwasi obi, unu we nānọdu n’ebe ewusiri ike, bú nime Jerusalem?

11 Hezekaia, ọ̀ dighi-akpali unu, ira unu nye ka unu nwua site n’oké unwu, site kwa n’akpiri-ikpọ-nku, si, Jehova, bú Chineke-ayi, gānaputa ayi n’ọbu-aka eze Asiria?

12 Ọ̀ bughi Hezekaia ahu wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, gwa Juda, gwa kwa Jerusalem, si, Ọ bu n’iru otù ebe-ichu-àjà ka unu gākpọ isi ala, ọ bu kwa n’elu ya ka unu gēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ?

13 Ùnu amaghi ihe m’mere ndi nile nke ala ọzọ nile, mu onwem na nnam-hà? chi mba nile nke ala ọzọ nile, hà puru inaputa ala-ha n’akam ma-ọli?

14 Ọ̀ bu onye n’etiti chi nile nke mba ndia, bú ndi nnam-hà wezugara ka ebibie ha, nke puru inaputa ndi-ya n’akam, na Chineke-unu puru inaputa unu n’akam?

15 Ma ub͕u a unu ekwela Hezekaia rafue unu, kpali kwa unu otú a, unu ekwe-kwa-la ya: n’ihi na ọ dighi chi ọ bula nke mba ọ bula ma-ọbu ala-eze ọ bula puru inaputa ndi-ya n’akam, ma-ọbu n’aka nnam-hà: n’ezie Chineke-unu agaghi-anaputa kwa unu n’akam.

16 Ndi-orù-ya kwu-kwa-ra okwu ọzọ imegide Jehova, bú Chineke, na imegide orù-Ya, bú Hezekaia.

17 Ọ de-kwa-ra akwukwọ, ita Jehova, bú Chineke Israel, uta, na ikwu okwu megide Ya, si, Dika chi mba nile nke ala ọzọ nile, ndi nānaputaghi ndi-ha n’akam, otú a Chineke Hezekaia agaghi-anaputa ndi-ya n’akam.

18 Ha we were oké olu kpọ ndi Jerusalem ndi nọ n’elu mb͕idi òkù n’asusu ndi-Ju, ime ka ha tua egwu, na ime ka ha ma jijiji; ka ha we were obodo-ha.

19 Ha we kwue okwu bayere Chineke Jerusalem, dika ha si ekwu okwu bayere chi nile nke ndi uwa, bú ọlu aka madu.

20 Hezekaia, bú eze, na Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, we kpe ekpere bayere ihe a, we tikue elu-igwe.

21 Jehova we ziga mọ-ozi, o we kpochapu ndi-dike nile bu dìnkpà, na ndi-ndú na ndi-isi, n’ọmuma-ulo-ikwū nke eze Asiria. O we were ihere iru laghachi n’ala-ya. O we ba n’ulo chi-ya, ndi siri na ngiri-afọ-ya we were mma-agha me ka ọ da nwua n’ebe ahu.

22 Jehova we zọputa Hezekaia na ndi bi na Jerusalem n’aka Senakerib, bú eze Asiria, na n’aka madu nile, we nēdu ha buruburu.

23 Ọtutu madu nēbute-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma, rue Jerusalem, ha nēbute-kwa-ra Hezekaia, bú eze Juda, ihe di oké ọnu-ahia: ewe bulie ya elu n’anya mba nile mb͕e ihe ndia gasiri.

24 Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria rue inwu: o we kpere Jehova; O we gwa ya okwu, nye ya ihe-ebube.

25 Ma ọ bughi dika nmeso emesoro ya ka Hezekaia nyeghachiri; n’ihi na obi-ya di elu: iwe we dikwasi ya, dikwasi kwa Juda na Jerusalem.

26 Hezekaia we ruru ala n’ihi idi-elu nke obi-ya, ya onwe-ya na ndi bi na Jerusalem, iwe Jehova abiakwasighi kwa ha n’ubọchi Hezekaia.

27 Hezekaia we nwe àkù na nsọpuru riri nne nke-uku: o we mere onwe-ya ulo-àkù idebe ọla-ọcha, na idebe ọla-edo, na idebe nkume di oké ọnu-ahia, na idebe uda di iche iche, na idebe ọta, na idebe ihe nile anāchọsi ike;

28 o me-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe idebe omume ọka na manya-vine ọhu na manu; na ulo anu nile ọ bula di iche iche, na ìgwè aturu n’ulo-anu.

29 O we mere onwe-ya obodo di iche iche, na ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n’uba: n’ihi na Chineke nyere ya àkù bara uba nke-uku.

30 Hezekaia nka b͕ochi-kwa-ra isi-iyi miri Gaihon di n’elu, we me ka miri ahu rùdazie n’akuku Ọdida-anyanwu obodo Devid. Ihe nāga-kwa-ra Hezekaia nke-ọma n’ọlu-ya nile.

31 Otú ọ di, n’okwu ndi-ukọ nke ndi-isi Babilon, ndi zitere ya ozi iju ajuju bayere ihe-ebude nke mere n’ala, Chineke rapuru ya inwa ya, ka O we mara ihe nile di n’obi-ya.

32 Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na ọlu-ebere-ya nile, le, edewo ha n’ọhù Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, n’akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.

33 Hezekaia we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, ha we lìe ya n’ebe-nrigo nke ílì umu Devid. Juda nile na ndi bi na Jerusalem we mere ya ihe-nsọpuru n’ọnwu-ya. Manase nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 33

1 Manase b͕ara arọ iri na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na ise nime Jerusalem.

2 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n’iru umu Israel.

3 Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya kwaturu, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Bealim, me kwa Asherot, kpọ kwa isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.

4 O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche iche n’ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka aham gādi rue mb͕e ebighi-ebi.

5 O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n’ogige abua nke ulo Jehova.

6 Onye ahu me-kwa-ra ka umu-ya ndikom gabiga nime ọku nime ndagwurugwu nwa Hinom: o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, me ihe-mb͕asi, meso onye nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.

7 Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke oyiyi-ihe ahu, bú nke o mere, n’ulo Chineke, bú nke Chineke siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, Ṅ’ulo a, na nime Jerusalem, nke M’rọputaworo n’ebo nile nke Israel, ka M’gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:

8 M’gaghi-esi kwa n’elu ala nke M’guzoro nye nna-unu-hà wezuga ukwu Israel ọzọ: nání ọ buru na ha elezi anya ime nile nke M’nyeworo ha n’iwu, bú iwu ahu nile na ukpuru nile na ikpé nile nke sitere n’aka Moses.

9 Manase we me ka Juda na ndi bi na Jerusalem sihie uzọ, ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n’iru umu Israel.

10 Jehova we gwa Manase okwu, gwa kwa ndi-ya: ma ha aṅaghi nti.

11 Jehova we me ka ndi-isi usu-ndi-agha nke eze Asiria nwere biakwasi ha, ha we jide Manase n’ọhia-ogwu, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, me ka o jerue Babilon.

12 Ma mbe anākpab͕u ya, ọ chọ ka iru Jehova, bú Chineke-ya, dajua, we ruru ala nke-uku n’iru Chineke nke nna-ya-hà.

13 O we kpere Ya; O we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, we nuru aririọ-amara-ya, me ka ọ lata na Jerusalem ba n’ala-eze-ya. Manase we mara na Jehova, Ya onwe-ya, bu Chineke.

14 Mb͕e ihe ndia gasiri, o wuere obodo Devid mb͕idi n’azu mb͕idi-ya, n’akuku Ọdida-anyanwu nke Gaihon, nime ndagwurugwu, we rue nbata n’ọnu-uzọ-ama azù; ọ b͕a kwa Ofel buruburu, me ka ọ di elu nke-uku: o do-kwa-ra ndi-isi usu-ndi-agha n’obodo nile ewusiri ike nime Juda.

15 O wezuga-kwa-ra chi nile nke ala ọzọ, si kwa n’ulo Jehova wezuga oyiyi-ihe ahu, ya na ebe-ichu-àjà nile nke o wuru n’ugwu ulo Jehova, na nime Jerusalem, o kpofue ha n’azu obodo.

16 O wue ebe-ichu-àjà Jehova, chua n’elu ya àjà, bú àjà-udo na àjà-ekele, ọ si Juda ka ha fè Jehova, bú Chineke Israel, òfùfè.

17 Otú ọ di, ndi Juda nọ nāchu àjà n’ebe di elu nile, ma ọ bu nání nye Jehova, bú Chineke-ha.

18 Ma ihe nile Manase mere nke fọduru, na ekpere-ya o kpere Chineke-ya, na okwu nile nke ndi-ọhu-uzọ, bú ndi gwara ya okwu n’aha Jehova, bú Chineke Israel, le, edewo ha n’akwukwọ ihe ndi-eze Israel mere.

19 Ekpere-ya kwa, na otú ekwere ka ọ riọta ìhe, na nmehie-ya nile, na nmekpu-ya, na ebe nile nke o wuru ebe di elu nime ha, guzo kwa Asherim na arusi apiri api, tutu o ruru ala: le, edewo ha n’akwukwọ okwu Hozai.

20 Manase we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, ha we lìe ya, n’ulo-ya: Emon nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

21 Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem.

22 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere: Emon we chuara arusi nile apiri api, bú nke Manase nna-ya mere, àjà, we fè ha òfùfè.

23 Ma o rurughi ala n’iru Jehova, dika Manase, bú nna-ya, ruru ala; kama Emon nka mere ka ikpe ma ya ri nne.

24 Ndi-orù-ya we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka ọ nwua n’ulo-ya.

25 Ndi ala ahu we tib͕ue ndi nile nēkekọta onwe-ha imegide eze, bú Emon: ndi ala ahu we me Josaia nwa-ya eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 34

1 Josaia b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iri na otù nime Jerusalem.

2 O me ihe ziri ezi n’anya Jehova, je ije n’uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe.

3 Ma n’arọ nke-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ya onwe-ya nọ na nwata, ọ malitere ichọ Chineke nke Devid nna-ya: n’arọ nke-iri-na-abua ka ọ malite-kwa-ra ime Juda na Jerusalem ka ha di ọcha pua n’ebe di elu nile, na Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu.

4 Ha we kwatue ebe-ichu-àjà Bealim n’iru ya; o b͕utue arusi-anyanwu nile, nke di n’ebe di elu n’elu ugwu; o tipia-kwa-ra Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu, ọ supia ha, fesa n’elu ílì ndi nāchuru ha àjà.

5 O sure ọkpukpu nke ndi-nchu-àjà n’elu ebe-ichu-àjà-ha, me ka Juda na Jerusalem di ọcha.

6 O me-kwa-ra otú a n’obodo nile nke Manase na Efraim na Simeon, we rue Naftali, nime nkpọnkpọ-ebe-ha nile buruburu.

7 Ọ kwatue ebe-ichu-àjà nile, tipia Asherim na arusi nile apiri api, ha we ghọ uzuzu, o b͕utu-kwa-ra arusi-anyanwu nile n’ala Israel nile, we lata na Jerusalem.

8 Ma n’arọ nke-iri-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ọ mesiri ka ala-ya na ulo ahu di ọcha, o zigara Shefan nwa Azalia, na Maaseia, bú onye-isi obodo ahu, na Joa nwa Joahaz, bú onye-ncheta, ime ulo Jehova, bú Chineke, ka ọ di ike.

9 Ha we biakute Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, nye ya ego ahu nke anēwebata n’ulo Chineke, nke ndi Livai, bú ndi nēche nbata-uzọ, chikọtara n’aka ndi Manase na Efraim, na n’aka ndi nile fọduru nke Israel, na n’aka Juda na Benjamin nile na ndi bi na Jerusalem.

10 Ha we nye ya n’aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ihe n’ulo Jehova; ndi nēje ozi ahu, bú ndi nālu ọlu n’ulo Jehova, we nye ya iji mezi ebe etipúru etipú na ime ka ulo ahu di ike;

11 ha we nye ya ndi-ọ̀kà n’osisi, nye kwa ndi nēwu ulo, iji zuta nkume awara awa, na osisi iji me ihe-njikọta, na ijikọta ulo nile nke ndi-eze Juda bibiri.

12 Ndikom ahu nālu ọlu n’ikwesi-ntukwasi-obi n’ozi ahu: ndi-nlekọta-ha bu kwa Jahat na Obadaia, ndi Livai, ndi sitere n’umu Merari; na Zekaraia na Meshulam, ndi sitere n’umu ndi Kohat, ibu ndi-isi: na ndi Livai ọzọ, bú ndi nile nwere nghọta n’ihe abù.

13 Ha bu kwa ndi-isi nke ndi-ibu, ha nēdu kwa ndi nile nēje ozi ifè òfùfè ọ bula: ufọdu nime ndi Livai bu kwa ndi-ode-akwukwọ, na ndi-odozi-okwu, na ndi-ọnu-ama.

14 Ma mb͕e ha nēweputa ego ahu nke anēwebata n’ulo Jehova, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara akwukwọ iwu Jehova nke enyere site n’aka Moses.

15 Hilkaia we za, si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n’ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu.

16 Shefan we būru akwukwọ ahu biakute eze, ọzọ kwa, o weghachiri eze okwu, si, Ihe nile enyere n’aka ndi-orù-gi, ha nēme ya.

17 Ha awupuwo kwa ego nke anāchọta n’ulo Jehova, ha we nye ya n’aka ndi-nlekọta ahu, na n’aka ndi nēje ozi ahu.

18 Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n’iru eze.

19 O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile.

20 Eze we nye Hilkaia, na Ahaikam nwa Shefan, na Abdon nwa Maika, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si,

21 Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi fọduru n’Israel na nime Juda, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n’ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke awusaworo ayi, n’ihi na nna-ayi-hà edebeghi okwu Jehova, ime dika ihe nile si di nke edeworo n’akwukwọ a.

22 Hilkaia, na ndi ahu eze gwara, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tokhat, nwa Hasra, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n’obodo nke-abua;) ha we gwa ya okwu otú a.

23 Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Sinu nwoke ahu nke ziri unu biakutem,

24 Otú a ka Jehova siri, Le, M’nēme ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú nkọcha nile nke edeworo n’akwukwọ ahu nke ha guworo n’iru eze Juda:

25 n’ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe wusa ọnumam n’ebe a, agaghi-emenyu kwa ya.

26 Ma eze Juda, onye nēzite unu iju Jehova ase, otú a ka unu gāsi ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Okwu ndia nke i nuworo,

27 n’ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n’iru Chineke, mb͕e i nuru okwu-Ya nile megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, i we ruru ala n’irum, dọwa kwa uwe-gi nile, kwa ákwá n’irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta.

28 Le, M’gāchikọta gi na nna-gi-hà n’ala-mọ, agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n’ílì-gi n’udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya. Ha we weghachiri eze okwu.

29 Eze we ziga, chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem.

30 Eze we rigorue ulo Jehova, ya na ndikom nile nke Juda, na ndi bi na Jerusalem, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi Juda nile, site n’onye uku we rue onye ntà; o we gua na nti-ha okwu nile nke akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu nke achọtaworo n’ulo Jehova.

31 Eze we guzo n’ọnọdu-ya, b͕a ndu n’iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n’iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n’akwukwọ a.

32 O we me onye ọ bula ahuru na Jerusalem na Benjamin ka o guzo. Ndi bi na Jerusalem we me dika ọb͕ub͕a-ndu Chineke si di, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

33 Josaia we si n’ala nile nke umu Israel nwere wezuga ihe-árú nile, me ndi nile ahuru n’Israel ka ha fè òfùfè, ọbuná ifè Jehova, bú Chineke-ha, òfùfè. Ubọchi-ya nile ha esighi n’iso Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, wezuga onwe-ha.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 35

1 Josaia we mere Jehova ememe ngabiga nime Jerusalem: ha we b͕ue anu ngabiga n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu.

2 O we guzo ndi-nchu-àjà n’ihe-ndebe nile ha, me ka ha di ike ifè òfùfè ulo Jehova.

3 Ọ si ndi Livai, bú ndi nēme Israel nile ka ha ghọta ihe, ndi di nsọ n’ebe Jehova nọ, Tiyenu ib͕e nsọ n’ulo ahu nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel, wuru; ibu agaghi-adiri unu n’ubu: ub͕u a fènu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-Ya, bú Israel, òfùfè.

4 Dozi-kwa-nu onwe-unu dika ulo nna-unu-hà si di n’òkè nile unu, dika odide-akwukwọ Devid, bú eze Israel, si di, na dika odide-akwukwọ Solomon nwa-ya si di.

5 Guzo-kwa-nu n’ebe nsọ dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu-nne-unu si di, bú umu ndi Israel, na òkè ulo nna ndi Livai.

6 B͕u-kwa-nu anu ngabiga, do kwa onwe-unu nsọ, dozi-kwa-ra umu-nne-unu ihe, ime dika okwu Jehova, site n’aka Moses, si di.

7 Josaia we bulie nye umu ndi Israel, bú ndi nile ahuru n’ebe ahu, ìgwè ewu na aturu, bú umu-aturu na umu-ewu, ha nile bu iji chu àjà-ngabiga, ọnu-ọgugu-ha ra ka orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù oké-ehi asa na ọgu iri: ndia sitere n’àkù eze.

8 Ndi-isi-ya buli-kwa-ra onyinye-afọ-ofufo nye ndi ahu, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai. Hilkaia na Zekaraia na Jehiel, bú ndi-ndú ulo Chineke, nyere ndi-nchu-àjà nnù ewu na aturu isi na ọgu iri, na ọgu ehi iri-na-isi, iji chu àjà-ngabiga.

9 Konanaia kwa, na Shemaia na Netanel, bú umu-nne-ya, na Hashabaia na Jeiel na Jozabad, bú ndi-isi nke ndi Livai, buliri nye ndi Livai nnù ewu na aturu iri-na-abua na ọgu iri, na nnù ehi na ọgu ise, iji chu àjà-ngabiga.

10 Ewe dozie òfùfè ahu, ndi-nchu-àjà we guzo n’ebe-nguzo-ha, na ndi Livai n’òkè nile ha, dika ihe eze nyere n’iwu si di.

11 Ha we b͕ue anu ngabiga ahu, ndi-nchu-àjà we wusa ọbara nke ha natara n’aka-ha, ndi Livai we nāb͕a akpukpọ-ha.

12 Ha we wezuga àjà-nsure-ọku, inye ha dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu ndi Israel si di, iweta ha nso Jehova, dika edeworo ya n’akwukwọ Moses. Otú a ka eme-kwa-ra ehi.

13 Ha we were ọku sie anu ngabiga dika ikpé-ya si di: ma ha siri ihe nsọ ọzọ nile n’ite, na n’ite isi miri, na n’ite-ofé, būru ha b͕akuru umu ndi Israel nile.

14 Emesia ha we doziere onwe-ha, dozi-kwa-ra ndi-nchu-àjà; n’ihi na ndi-nchu-àjà, bú umu Eron, nọ n’isure àjà-nsure-ọku na abuba rue abali: ndi Livai we doziere onwe-ha, dozi-kwa-ra ndi-nchu-àjà, bú umu Eron.

15 Ndi-ọbù-abù, bú umu Esaf, nọ kwa n’ebe-nguzo-ha, dika ihe Devid, na Esaf, na Himan, na Jedutun, bú onye-ọhu-uzọ eze, nyere n’iwu si di; ndi-ọnu-uzọ-ama nọ kwa n’ọnu-uzọ-ama nile ọ bula: ha enweghi ike isi n’òfùfè-ha wezuga onwe-ha, kama umu-nne-ha, bú ndi Livai, doziri ihe nye ha.

16 Ewe dozie òfùfè nile nke Jehova n’ubọchi ahu, ime ememe ngabiga, na isure àjà-nsure-ọku n’elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, dika ihe eze, bú Josaia, nyere n’iwu si di.

17 Umu Israel ndi ahuru n’ebe ahu we me ememe ngabiga na mb͕e ahu, na ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa.

18 Emeghi kwa ememe ngabiga dika nka n’Israel site n’ubọchi Samuel, bú onye-amuma; ọ dighi kwa eze Israel ọ bula mere ememe ngabiga dika ememe ngabiga ahu nke Josaia mere, ya na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Juda na Israel nile ahuru n’ebe ahu, na ndi bi na Jerusalem.

19 ọ bu n’arọ nke-iri-na-asatọ nke ọbubu-eze Josaia ka emere ememe ngabiga nka.

20 Mb͕e ihe a nile gasiri, mb͕e Josaia dozisiri ulo Chineke, Neko, bú eze Ijipt, rigoro ibuso Kakemish n’akuku Yufretis agha: Josaia we pua izute ya.

21 O we zigara ya ndi-ozi, si, Gini ka mu na gi nwekọrọ, eze Juda? ọ bughi imegide gi onwe-gi ka m’biaworo ta, kama ijekuru ulo ahu nke m’nēbuso ha agha: ma Chineke siri ka m’me ngwa: gi onwe-gi ra aka-gi n’ebe Chineke nọ, Onye nọyerem, ka Ọ ghara ibibi gi.

22 Ma Josaia esighi n’ebe ọ nọ chigharia iru-ya, kama o nwoghariri onwe-ya ibuso ya agha, ọ geghi kwa nti okwu Neko, bú nke sitere n’ọnu Chineke, o we bia ibu agha nime ndagwurugwu Megido.

23 Ndi-ọb͕a-uta we b͕a eze, bú Josaia; eze we si ndi-orù-ya, Bubiganum; n’ihi na ọria nāriam nke-uku.

24 Ndi-orù-ya we si n’ub͕ọ-ala ahu bubiga ya, me ka ọ nọdu n’ub͕ọ-ala nke-abua nke o nwere, ha we me ka o jerue Jerusalem; o we nwua, elìe ya n’ílì nna-ya-hà. Juda na Jerusalem nile we ruere Josaia újú.

25 Jeremaia we bùara Josaia abù-ákwá: ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom nile we nēkwu okwu bayere Josaia rue ta n’abù-ákwá-ha; ha we tiye ha ibu ukpuru n’ebe Israel nọ: ma, le, edewo ha n’akwukwọ abù-ákwá.

26 Ma ihe nile Josaia mere nke fọduru, na ọlu-ebere-ya nile, dika ihe edeworo n’iwu Jehova si di,

27 na ihe nile o mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n’akwukwọ ndi-eze Israel na Juda.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 36

1 Ndi ala ahu we kuru Jehoahaz nwa Josaia, me ya eze n’ọnọdu nna-ya nime Jerusalem.

2 Joahaz b͕ara orú arọ na atọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọnwa atọ nime Jerusalem.

3 Eze Ijipt we wezuga ya nime Jerusalem, rie ala ahu nra ọgu talent ọla-ọcha ise na otù talent ọla-edo.

4 Eze Ijipt we me Elaiakim, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem, gugharia ya aha Jehoiakim. Neko we were Joahaz nwa-nne-ya, me ka ọ biarue Ijipt.

5 Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, bú Chineke-ya.

6 Nebukadneza, bú eze Babilon, we rigota imegide ya, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, ime ka o jerue Babilon.

7 Nebukadneza we chiri ufọdu n’ihe ulo Jehova chibata na Babilon, o tiye ha n’ulo uku ya nime Babilon.

8 Ma ihe nile Jehoiakim mere nke fọduru, na ihe-árú-ya nile nke o mere, na ihe achọputaworo imegide ya, le, edewo ha n’akwukwọ ndi-eze Israel na Juda: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n’ọnọdu-ya.

9 Jehoiakin b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze ọnwa atọ na ubọchi iri nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.

10 Ma n’ọb͕ub͕a arọ, eze, bú Nebukadneza, zìri, me ka ọ biarue Babilon, ya na ihe nile anāchọsi ike nke ulo Jehova, o we me Zedakaia, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem.

11 Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem:

12 o me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, bú Chineke-ya; o rurughi ala n’iru Jeremaia, bú onye-amuma, onye nēkwu okwu site n’ọnu Jehova.

13 Ọzọ kwa, o nupuru isi n’okpuru eze, bú Nebukadneza, onye mere ka o were Chineke ṅua iyi: o we kwesie olu-ya ike, b͕a obi-ya ume, ka ọ ghara ichigharikute Jehova, bú Chineke Israel.

14 Ndi-isi nile nke ndi-nchu-àjà, na ndi Juda, mekpu-kwa-ra ihe-nmekpu ri nne, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di; ha we merua ulo Jehova nke O doro nsọ nime Jerusalem.

15 Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we zigara ha ozi n’aka ndi-ozi-Ya, nēbili n’isi-ututu, nēzì kwa; n’ihi na O nwere ọmiko n’aru ndi-Ya na n’ebe ebe-obibi-Ya di:

16 ha we nēme ndi-ozi Chineke ka ha buru ihe-ọchì, ha nēlelì kwa okwu-Ya anya, nēme kwa onwe-ha ndi-aghughọ n’ebe ndi-amuma-Ya nọ, rue mb͕e ọnuma Jehova lara elu imegide ndi-Ya, rue mb͕e ngwọta nādighi.

17 O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n’ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n’aru nwa-okorọbia, ma ọbu n’aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n’aru okenye, ma-ọbu n’aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n’aka-ya.

18 Ihe nile nke ulo Chineke, ihe uku na ihe ntà, na àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke eze na ndi-isi-ya; ihe ndia nile ka ọ chibatara na Babilon.

19 Ha we sure ulo Jehova ọku, kwatu kwa mb͕idi Jerusalem, sure kwa ulo-elu-ya nile n’ọku, na ihe-ya nile anāchọsi ike, ibibi ha.

20 O me ndi fọduru site na mma-agha ka ha je biri na Babilon; ha we ghọrọ ya, ghọ-kwa-ra umu-ya, ndi-orù rue ọbubu-eze ala-eze Peasia:

21 imezu okwu Jehova nke sitere n’ọnu Jeremaia, rue mb͕e ubọchi-izu-ike-ya nile tọsiri ala ahu utọ: ubọchi nile nke ntọb͕ọrọ-n’efu-ya ọ kwusiri ọlu, imezu ọgu arọ atọ na iri.

22 Ma n’arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n’ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n’ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n’odide-akwukwọ, si,

23 Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m’buru onye-nlekọta n’iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda. Ònye nọ n’etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya, ya rigo kwa.