Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 21

1 Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Devid: Jehoram nwa-ya we buru eze n’ọnọdu-ya.

2 O nwe-kwa-ra umu-nne-ndikom, bú umu Jehoshafat, aha-ha bu Azaraia, na Jehiel, na Zekaraia, na Azaraia, na Maikael, na Shefataia: ndia nile bu umu-ndikom Jehoshafat, bú eze Israel.

3 Nna-ha we nye ha ọtutu onyinye, nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ihe di oké ọnu-ahia, ha na obodo ewusiri ike nime Juda: ma ala-eze ka o nyere Jehoram, n’ihi na onye ahu bu ọkpara.

4 Jehoram we bilie ibu onye-isi ala-eze nna-ya, o we me onwe-ya ka ọ di ike, were mma-agha b͕ue umu-nne-ya ndikom nile, ọzọ kwa, o b͕uru ufọdu nime ndi-isi Israel.

5 Orú arọ na iri na abua ka Jehoram b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ asatọ na Jerusalem.

6 O je ije n’uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n’ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka ọ nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.

7 Ma Jehova ekweghi ibibi ulo Devid, n’ihi ọb͕ub͕a-ndu ahu Ya na Devid mere, dika Ọ si-kwa-ra na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.

8 N’ubọchi-ya ka Edom siri n’okpuru aka Juda jehie, mere onwe-ha eze.

9 Jehoram we gabiga, ya na ndi-isi-ya, ub͕ọ-ala-ya nile so-kwa-ra ya: o rue na o biliri n’abali, tib͕ue Edom ndi nāb͕a ya buruburu, ha na ndi-isi ub͕ọ-ala.

10 Edom we si n’okpuru aka Juda jehie, rue ta: mb͕e ahu ka Libna siri n’okpuru aka-ya jehie n’otù mb͕e ahu: n’ihi na ọ rapuru Jehova, bú Chineke nke nna-ya-hà.

11 Onye ahu me-kwa-ra ebe di elu n’ugwu nile nke Juda, we me ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, ọ rafu-kwa-ra Juda.

12 Odide-akwukwọ we si n’aka Elaija, bú onye-amuma, biakute ya, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Devid nna-gi, siri, N’ihi na i jeghi ije n’uzọ nile nke Jehoshafat nna-gi, ma-ọbu n’uzọ nile nke Esa, bú eze Juda;

13 kama i jewo ije n’uzọ ndi-eze Israel, me Juda na ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, dika ulo Ehab mere ka akwa iko; ọzọ kwa, umu-nne-gi ndikom, bú ulo nna-gi, ndi di nma kari gi onwe-gi, ka i b͕uworo:

14 le, Jehova nēti ihe-otiti uku n’etiti ndi-gi na n’etiti umu-gi, na n’etiti ndinyom-i, na n’etiti àkù-gi nile:

15 gi onwe-gi kwa, O gēji ọtutu ọria, n’ọria ngiri-afọ-gi, tie gi, rue mb͕e ngiri-afọ-gi gāputa site n’ọria ahu kwa-ubọchi.

16 Jehova we kpọte mọ nke ndi Filistia, na nke Arebia, ndi nọ n’akuku ndi Etiopia, imegide Jehoram:

17 ha we rigo imegide Juda, we tipúe ya, dọta àkù nile ahuru n’ulo eze, na umu-ya ndikom kwa, na ndinyom-ya, n’agha; ọ dighi kwa nwa-nwoke fọduru ya, ọ bu nání Jehoahaz, bú nke-ntà nime umu-ya ndikom.

18 Ma mb͕e ihe nile a gasiri Jehova were ọria nke nādighi ngwọta tie ya na ngiri-afọ-ya.

19 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, ọbuná na mb͕e ọgwugwu arọ abua gasiri, na ngiri-afọ-ya putara n’ọria-ya, o we nwua n’ajọ ọria. Ma ndi-ya esureghi nsure-ọku nye ya dika nsure-ọku nke nna-ya-hà.

20 Orú arọ na iri na abua ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze na Jerusalem arọ asatọ: o we la buru onye anāchọsighi ike ka ọ di ndu; ha we lìe ya n’obodo Devid, ma ọ bughi n’ílì ndi-eze.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 22

1 Ndi bi na Jerusalem we me Ehazaia nwa-ya nke-ntà eze n’ọnọdu ya: n’ihi na usu ndi nāpunara madu ihe, bú ndi soro ndi Arebia ba n’ọmuma-ulo-ikwū, b͕uru ndi nile bu ya okenye. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we buru eze.

2 Ọgu arọ abua na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem: ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri.

3 Ya onwe-ya je-kwa-ra ije n’uzọ nile nke ulo Ehab: n’ihi na nne-ya bu onye nādu ya ọdu imebi iwu.

4 O we me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n’ihi na ndi ahu buru ya ndi nādu ọdu mb͕e ọnwu nna-ya gasiri, iwetara ya nbibi.

5 O jeghari-kwa-ra n’idu-ọdu-ha, we soro Jehoram nwa Ehab, bú eze Israel, ibuso Hazael, bú eze Siria, agha na Remot-gilead: ndi Siria we tib͕ue Joram.

6 O we lata ka agwọ ya nime Jezreel n’ihi ntib͕u nke ha tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Azaraia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Jehoram nwa Ehab nime Jezreel, n’ihi na ọ nāria ọria.

7 Ma o sitere na Chineke, bú nzọda Ehazaia, n’ibiakute Joram: n’ihi na mb͕e ọ biara, o we so Jehoram pukuru Jihu nwa Nimshi, onye Jehova tere manu ibipu ulo Ehab.

8 O rue, mb͕e Jihu nēme ulo Ehab ihe ekpere n’ikpe, na ọ huru ndi-isi Juda, na umu-ndikom nke umu-nne Ehazaia, ndi nējere Ehazaia ozi, o we b͕ue ha.

9 O we chọ Ehazaia, ha we jide ya, (ma onye ahu nēzo onwe-ya nime Sameria,) ha we me ka ọ biakute Jihu, me ka ọ nwua; ha we lìe ya, n’ihi na ha siri, Nwa Jehoshafat ka ọ bu, onye were obi-ya nile chọ Jehova. Ma ulo Ehazaia enweghi onye nwere ike ijide ala-eze.

10 Mb͕e Atalaia, bú nne Ehazaia, huru na nwa-ya nwoke anwuwo, o bilie, me ka nkpuru nile la n’iyì, bú ndi nwe ala-eze ulo Juda.

11 Ma Jehoshabeat, bú nwa-nwayi eze, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n’etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n’ime-ulo nke ihe-ndina. Jehoshabeat nwa-nwayi eze, bú Jehoram, nwunye Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, (n’ihi na nwayi ahu bu nwa-nne Ehazaia,) we zopu ya n’iru Atalaia, o we ghara ime ka ọ nwua.

12 O we nọ n’aka-ha n’ulo Chineke nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 23

1 Ma n’arọ nke-asa Jehoiaba mere onwe-ya ka ọ di ike, o we chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, bú Azaraia nwa Jehoram, na Ishmael nwa Jehohanan, na Azaraia nwa Obed, na Maaseia nwa Adaia, na Elishafat nwa Zikri, me ka ya na ha b͕a ndu.

2 Ha we nāga buruburu nime Juda, chikọputa ndi Livai n’obodo nile nke Juda, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ha we biarue Jerusalem.

3 Nkpọkọta ahu nile na eze we b͕a ndu n’ulo Chineke. Ọ si ha, Le, nwa eze gābu eze, dika Jehova kwuworo bayere umu Devid.

4 Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n’uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n’ubọchi-izu-ike, bú nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai, gābu ndi-ọnu-uzọ-ama nke nbata-uzọ nile;

5 otù uzọ n’uzọ atọ gānọ kwa n’ulo eze, otù uzọ n’uzọ atọ kwa n’ọnu-uzọ-ama nke ntọ-ala: ndi Juda nile gānọ kwa n’ogige ulo Jehova nile.

6 Ma ka onye ọ bula ghara ibà n’ulo Jehova, ọ bu nání ndi-nchu-àjà, na ndi n’etiti ndi Livai ndi nēje ozi; ndi ahu gābà, n’ihi na ndi nsọ ka ha bu: ma ndi Juda nile gēdebe ihe-ndebe ulo Jehova.

7 Ndi Livai gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n’aka-ya; ma onye nābata n’ulo, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nābà nime, na mb͕e ọ nāpu n’èzí.

8 Ndi Livai na Juda nile we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n’iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n’ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n’ubọchi-izu-ike; n’ihi na Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, emeghi ka òkè di iche iche pua n’ije-ozi-ha.

9 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise ube, na ọta, na ọta ntà, nke eze, bú Devid, nwereri, nke di n’ulo Chineke.

10 O guzo ndi Juda nile, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n’aka-ya, site n’akuku aka-nri ulo ahu rue akuku aka-ekpe ulo ahu, n’akuku ebe-ichu-àjà na n’akuku ulo, n’akuku eze buruburu.

11 Ha we me ka nwa eze puta, ha we kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà, me ya eze: Jehoiada na umu-ya ndikom we te ya manu; ha we si, Ka eze di ndu.

12 Atalaia we nu olu ndi Juda ka ha nāb͕a ọsọ nēto kwa eze, o we biakute ndi ahu n’ulo Jehova:

13 ọ hu, ma, le, eze nēguzo n’akuku ogidi-ya na nbata, ndi-isi na opì-ha di kwa n’akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì; ndi-ọbù-abù ji kwa ihe abù kpọ, ndi nēme ka amara ito otuto nọ kwa. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.

14 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we me ka ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise puta, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n’etiti ariri; ma onye nābiaso ya n’azu, ka ewere mma-agha me ka ọ nwua:n’ihi na onye-nchu-àjà siri, Unu emela ka ọ nwua n’ulo Jehova.

15 Ha we doro ya onwe-ha n’akuku abua; o we ba na nbata nke ọnu-uzọ-ama inyinya n’ulo eze: ha we me ka ọ nwua n’ebe ahu.

16 Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n’etiti ya na ndi Juda nile na eze, na ha gābu ndi Jehova nwere.

17 Ndi Juda nile we ba n’ulo Beal, kwatue ya, tupia ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n’iru ebe-ichu-àjà ahu.

18 Jehoiada we tiye nlekọta nile nke ulo Jehova n’aka ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi Devid kère n’òkè ibu ndi-isi ulo Jehova, isure àjà-nsure-ọku nile nke Jehova, dika edeworo ya n’iwu Moses, n’ọṅù, na n’ibù-abù, site n’aka Devid.

19 O we guzo ndi-ọnu-uzọ-ama n’ọnu-uzọ-ama nile nke ulo Jehova, ka onye ruru árú n’uzọ ọ bula we ghara ibà nime.

20 O we chiri ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi di ike nke-uku, na ndi nāchi achi n’etiti ndi Juda, na ndi nile nke ala ahu, me ka eze si n’ulo Jehova rida: ha we si n’etiti ọnu-uzọ-ama nke di n’elu ba n’ulo eze, me ka eze nọkwasi n’oche-eze nke ala-eze.

21 Ndi nile nke ala ahu we ṅuria ọṅu, obodo ahu di-kwa-ra jū: ha we were mma-agha me ka Atalaia nwua.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 24

1 Joash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba.

2 Joash we me ihe ziri ezi n’anya Jehova ubọchi nile nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà.

3 Jehoiada we lutara ya ndinyom abua; o we mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

4 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na ọ di n’obi Joash ime ka ulo Chineke di ọhu.

5 O we chikọta ndi-nchu-àjà na ndi Livai, si ha, Puanu, jerue obodo nile nke Juda, chikọputa ego n’Israel nile ime ka ulo Chineke-unu di ike kwa-arọ, unu onwe-unu kwa, menu ngwa ime ihe ahu. Ma ndi Livai emeghi ngwa.

6 Eze we kpọ Jehoiada, bú onye-isi, si ya, Gini mere i jughi ndi Livai ka ha si na Juda, si kwa na Jerusalem, webata ùtú nke Moses, bú orù Jehova, na nke nkpọkọta nke Israel, nke diri ulo-ikwū ihe-àmà?

7 N’ihi na Atalaia, bú nwayi ahu nēmebi iwu, umu-ya ndikom tipúru ulo Chineke; ọzọ kwa, ha were ihe nsọ nile nke ulo Jehova nye Bealim.

8 Eze we gwa ha, ha we me otù ib͕e, dọba ya n’ọnu-uzọ-ama ulo Jehova n’èzí.

9 Ha we kpọsa na Juda na nime Jerusalem, ka ewebatara Jehova utu nke Moses, bú orù Chineke, tukwasiri Israel n’ọzara.

10 Ndi-isi nile na ndi Juda nile we ṅuria ọṅu, webata ihe, tubà ya n’ib͕e ahu, rue mb͕e ha nyebìri.

11 O rue, mb͕e ebubatara ib͕e ahu n’ulo-nlekọta eze site n’aka ndi Livai, mb͕e ha hu-kwa-ra na ego ahu riri nne, na ode-akwukwọ eze na onye-nlekọta nke onye-isi-nchu-àjà biara, wupu ihe di n’ib͕e, būru ya, bughachi ya n’ọnọdu-ya. Otú a ka ha mere kwa-ubọchi, ha we chikọta ego n’uba.

12 Eze na Jehoiada we were ya nye ndi nēje ozi òfùfè ulo Jehova; ha we nēgo ndi nāwa nkume na ndi-ọ̀kà n’osisi ime ka ulo Jehova di ọhu, ha were kwa ya nye ndi-ọ̀kà n’ígwè na ọla ime ka ulo Jehova di ike.

13 Ndi nēje ozi ahu we lua ọlu, ewe jezue ozi ahu n’aka-ha, ha we guzo ulo Chineke dika ọtùtù-ya si di, me ka o sie ike.

14 Mb͕e ha lubìri, ha we weta n’iru eze na Jehoiada ego fọduru, ha we were ya mere ulo Jehova ihe, bú ihe ozi, na isure àjà-nsure-ọku, na ngaji, na ihe ọla-edo na ọla-ọcha. Ha we nēsure àjà-nsure-ọku n’ulo Jehova mb͕e nile ubọchi nile nke Jehoiada.

15 Jehoiada we ghọ agadi, ubọchi ndu-ya we ju ya afọ, o we nwua; ọgu arọ isi na iri ka ọ b͕ara mb͕e ọ nwuru.

16 Ha we lìe ya n’obodo Devid n’etiti ndi-eze, n’ihi na o mere ezi ihe n’Israel, na n’ebe Chineke na ulo-Ya di.

17 Ma mb͕e ọnwu Jehoiada gasiri, ndi-isi Juda biara, kpọ isi ala nye eze. Mb͕e ahu eze gere ha nti.

18 Ha we rapu ulo Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we fè Asherim na arusi òfùfè: iwe we dikwasi Juda na Jerusalem n’ikpe-ọmuma-ha nka.

19 O zite ndi-amuma n’etiti ha, ime ka ha laghachikute Jehova; ha we b͕a àmà megide ha: ma ha aṅaghi nti.

20 Mọ Chineke we were Zekaraia nwa Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we guzo n’elu n’ebe ndi Juda nọ, si ha, Otù a ka Chineke siri; N’ihi gini ka unu onwe-unu nāgabiga ihe nile Jehova nyere n’iwu, ihe we ghara igara unu nke-ọma? n’ihi na unu arapuwo Jehova, Ọ rapuwo kwa unu.

21 Ha we kekọta onwe-ha imegide ya, were nkume tub͕ue ya, n’ihi ihe eze nyere n’iwu, n’ogige ulo Jehova.

22 Joash, bú eze, echetaghi kwa ebere nke Jehoiada, bú nna-ya, mere ya, o we b͕ue nwa-ya. Ma mb͕e ọ nwuru, ọ si, Ka Jehova hu ya, ju ase.

23 O rue, n’ọb͕ub͕a arọ, na usu-ndi-agha Siria rigoro imegide ya: ha we biarue Juda na Jerusalem, bilie ndi-isi nile nke ndi Juda site n’etiti ndi ahu, ha we zigara eze Damaskọs ihe-nkwata-ha nile.

24 N’ihi na usu-ndi-agha Siria chiri ndikom ole-na-ole bia; Jehova we nye usu-ndi-agha bara uba nke-uku n’aka-ha, n’ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. Ha we me Joash ihe nile ekpere n’ikpe.

25 Ma mb͕e ha siri n’ebe ọ nọ la, (n’ihi na ha rapuru ya n’ọtutu ọria,) ndi-orù-ya kekọtara onwe-ha imegide ya n’ihi ọbara umu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, b͕ue ya n’elu ihe-ndina-ya, o we nwua: ha we lìe ya n’obodo Devid, ma ha elìghi ya n’ílì ndi-eze.

26 Ma ndia bu ndi nēkekọta onwe-ha imegide ya; bú Zabad nwa Shimeat nwayi Amon, na Jehozabad nwa Shimrit nwayi Moab.

27 Ma ihe bayere umu-ya ndikom, na iba-uba nke ibu eboro ya, na ntọ-ala ulo Chineke, le, edewo ha n’akukọ akwukwọ ndi-eze. Amazaia nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 25

1 Amazaia b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jehoadan nke Jerusalem.

2 O me ihe ziri ezi n’anya Jehova, nání na o weghi obi zuru okè me ya.

3 O rue, mb͕e ala-eze di ike n’ebe ọ nọ, na o b͕uru ndi-orú-ya ndi tib͕uru eze, bú nna-ya.

4 Ma o meghi ka umu-ha nwua, kama o mere dika ihe edeworo n’iwu n’akwukwọ Moses, nke Jehova nyere n’iwu, si, Ndi bu nna agaghi-anwu n’ọnọdu umu-ha, umu agaghi-anwu kwa n’ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya.

5 Amazaia we chikọta Juda, guzo ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nye ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, nye kwa ndi-isi usu ọgu ndikom ise, bú Juda na Benjamin nile: o we gukọta ha, site n’onye b͕ara orú arọ we gaba n’iru, o we hu na ha di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēji ube na ọta.

6 O we were ọgu talent ọla-ọcha ise go orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, site n’Israel.

7 Ma onye nke Chineke biakutere ya, si, Eze, ka usu-ndi-agha Israel ghara iso gi bia; n’ihi na Jehova anọyeghi Israel, bú umu nile nke Efraim.

8 Otú ọ di, gi onwe-gi bia, me ihe, di ike ibu agha: Chineke gēme ka i ghara iso ngọngọ n’iru onye-iro-gi; n’ihi na ike di nime Chineke iye aka na ime ka asu ngọngọ.

9 Amazaia we si onye nke Chineke ahu, Ma gini ka ayi gēme bayere ọgu talent ise ahu nke m’nyeworo usu ndi nāpunara madu ihe nke Israel? Onye nke Chineke we si, Jehova nwere ihe inye gi nke bara uba kari.

10 Amazaia we kewapu ha, bú usu ndi nāpunara madu ihe nke siri n’Efraim biakute ya, ka ha laghachi n’ebe-ha: iwe-ha we di ọku nke-uku megide Juda, ha we laghachi n’ebe-ha n’iwe di ọku.

11 Amazaia we me onwe-ya ka ọ di ike, o we duru ndi-ya, je Ndagwurugwu Nnù, tib͕ue umu Sia, orú nnù ndikom na nnù ise.

12 Ma orú nnù ndikom na nnù ise ọzọ ndi di ndu, umu Juda dọtara ha n’agha, me ka ha bia n’elu nkume di elu, ha we si n’elu nkume di elu ahu tuda ha, ewe tupia ha nile.

13 Ma ndikom nke usu ndi nāpunara madu ihe nke Amazaia zilagara, ka ha ghara iso ya je agha, madere n’obodo nile nke Juda, site na Sameria we rue Bet-horon, tib͕ue nnù madu asa na ọgu iri nime ha, luta ihe-nluta bara uba n’agha.

14 O rue, mb͕e Amazaia latara site na ntib͕u ndi Edom, na ọ chibatara chi nke umu Sia, guzoro ha onwe-ya ibu chi, we kpọ isi ala n’iru ha, surere ha ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ.

15 Iwe Jehova we di ọku imegide Amazaia, o we zigara ya onye-amuma, nke siri ya, N’ìhi gini ka i chọworo chi nke ndi ahu, ndi nānaputaghi ndi-ha n’aka-gi?

16 O rue, mb͕e ọ nāgwa ya okwu, na eze siri ya, Ọ̀ bu iburu eze onye nādu ọdu ka ayi meworo gi? ra aka; n’ìhi gini ka agētib͕u gi? Onye-amuma ahu we ra aka, si, Amawom na Chineke ezubewo ibibi gi, n’ihi na i mewo nka, i geghi kwa idu-ọdum nti.

17 Amazaia, bú eze Juda, we nara idu-ọdu, zigara Joash nwa Jehoahaz, nwa Jihu, bú eze Israel, ozi, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n’iru.

18 Joash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu.

19 I siwo, Le, i tib͕uwo Edom; obi-gi we bulie gi elu isọpuru onwe-gi: ub͕u a nọdu n’ulo-gi; n’ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n’ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi?

20 Ma Amazaia anughi; n’ihi na Chineke ka o sitere, ka O we nye ha n’aka ndi-iro-ha, n’ihi na ha chọrọ chi Edom.

21 Joash, bú eze Israel, we rigo; ya onwe-ya na Amazaia, bú eze Juda, we lerita onwe-ha anya n’iru na Bet-shemesh, nke Juda nwere.

22 Ewe tib͕ue Juda n’iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n’ulo-ikwū-ya.

23 Joash, bú eze Israel, we Jide Amazaia, bu eze Juda, nwa Joash nwa Jehoahaz, nime Bet-shemesh, me ka ọ biarue Jerusalem, we tipue mb͕idi Jerusalem site n’ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit.

24 Ọ chiri ọla-edo na ọla-ọcha nile, na ihe nile ahutara n’ulo Chineke n’aka Obed-edom, na àkù nile nke ulo eze, na ndi edoro na mbe, o we laghachi na Sameria.

25 Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Joash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise.

26 Ma ihe nile nke Amazaia mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ndi-eze Juda na Israel?

27 Ma site na mb͕e Amazaia siri n’iso Jehova wezuga onwe-ya ha kekọtara nkekọta-madu imegide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n’ebe ahu.

28 Ha we bute ya n’elu inyinya, lìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Juda.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 26

1 Ndi nile nke Juda we were Uzaia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n’ọnọdu nna-ya Amazaia.

2 Ya onwe-ya wuru Ilot, nyeghachi ya Juda, mb͕e eze sorosiri nna-ya-hà dina n’ọnwu.

3 Arọ iri na isi ka Uzaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jekilia nke Jerusalem.

4 O me ihe ziri ezi n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke Amazaia nna-ya mere.

5 O we nọ n’ichọ Chineke n’ubọchi Zekaraia, onye nwere nghọta n’ihu Chineke: ma n’ubọchi ọ nāchọ Jehova, Chineke mere ka ihe gara ya nke-ọma.

6 O we pua, buso ndi Filistia agha, tipúsia mb͕idi Gat, na mb͕idi Jabne, na mb͕idi Ashdod, o we wue obodo n’ala Ashdod na n’etiti ndi Filistia.

7 Chineke we yere ya aka imegide ndi Filistia, na imegide ndi Arebia ndi bi na Gua-beal, na Meunim.

8 Ndi Amon we nye Uzaia onyinye-inata-iru-ọma: aha-ya we rue nbata Ijipt; n’ihi na o mere onwe-ya ka ọ di ike ri nne.

9 Uzaia wu-kwa-ra ulo-elu nime Jerusalem n’ọnu-uzọ-ama nkuku, na n’ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, na na nkuku mb͕idi, we me ka ha di ike.

10 O wu-kwa-ra ulo-elu ufọdu n’ọzara, gwue ọtutu olùlù-miri, n’ihi na o nwere ọtutu anu-ulo; ma n’ebe di ala ala, ma n’ebe di lari: o nwe-kwa-ra ndi-ọlu-ubi na ndi-ọlu-ubi-vine n’ugwu na nime Kamel; n’ihi na ọ bu onye huru ọlu ubi n’anya.

11 Uzaia nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu agha, ndi nāpukuru usu-ndi-agha n’usu n’usu, dika ọnu-ọgugu nke ngukọta-ha si di n’aka Jeiel, bú ode-akwukwọ, na Maaseia, bú odozi-okwu, n’okpuru aka Hananaia, otù onye nime ndi-isi eze.

12 Ọnu-ọgugu nile nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-dike bu dìnkpà, di nnù isi na ọgu iri.

13 Ma n’okpuru aka-ha ka usu nke usu-ndi-agha di, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asatọ na nnù asatọ na ọgu iri-na-ise, ndi nēwere ume nke ndi bu dìnkpà bu agha, iyere eze aka imegide onye-iro.

14 Uzaia we doziere ha, bú usu-ndi-agha nile, ọta, na ube, na okpu-agha, na uwe-agha, na ute, ọbuná rue nkume èbè.

15 O me kwa nime Jerusalem ihe-agha echèputara, bú nchèputa nke onye nēchèputa ihe, idi n’elu ulo-elu nile, na n’elu nkuku mb͕idi nile, iji b͕a àkú na nkume uku. Aha-ya we pua rue ebe di anya; n’ihi na eyere ya aka n’uzọ di ebube, rue mb͕e ọ di ike.

16 Ma mb͕e ọ di ike, obi-ya di elu rue nbibi, o we mekpu emekpu megide Jehova, bú Chineke-ya; o we ba n’ulo uku Jehova isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’elu ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

17 Azaraia, bú onye-nchu-àjà, we baso ya, ya na ọgu ndi-nchu-àjà anọ nke Jehova, bú ndi-dìnkpà:

18 ha we guzo imegide Uzaia, bú eze, si ya, Uzaia, ọ bughi gi nwe isurere Jehova ihe-nsure-ọku nēsì utọ, kama ọ bu ndi-nchu-àjà, bú umu Eron, ndi edoworo nsọ isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: pua n’ebe nsọ a; n’ihi na i mekpuwo emekpu; ọ gaghi-adi-kwa-ra gi ihe nsọpuru site n’aka Jehova, bú Chineke.

19 Uzaia we wee iwe; ma ihe eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ di n’aka-ya isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ma mb͕e o nēkosa ndi-nchu-àjà ọnuma, ekpenta wara n’egedege-iru-ya, n’iru ndi-nchu-àjà n’ulo Jehova, n’akuku ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

20 Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nile, we le ya anya, ma, le, ya onwe-ya bu onye-ekpenta n’egedege-iru-ya, ha we me ka ọ pua n’ebe ahu n’ima-jijiji;ọzọ kwa, ya onwe-ya mere ngwa ipu apu, n’ihi na Jehova etib͕uwo ya.

21 Uzaia, bú eze, we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n’ulo ewupuru iche, ebe ọ bu onye-ekpenta; n’ihi na ebipuru ya n’ulo Jehova: Jotam nwa-ya we buru onye-isi ulo eze, nēkpe ndi ala ahu ikpe.

22 Ma ihe nile nke Uzaia mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, dere ha n’akwukwọ.

23 Uzaia we so nna-ya-hà dina n’ọnwu; ha we lìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’ọhia olìlì nke ndi-eze nwere; n’ihi na ha siri, Onye-ekpenta ka ọ bu: Jotam nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 27

1 Orú arọ na ise ka Jotam b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok.

2 O me ihe ziri ezi n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke Uzaia nna-ya mere: nání na ọ baghi n’ulo uku Jehova. Ma ndi Juda nọ nēbibi onwe-ha.

3 Onye ahu wuru ọnu-uzọ-ama ulo Jehova nke di n’elu, o wu-kwa-ra ulo n’uba n’elu mb͕idi Ofel.

4 O wu-kwa-ra obodo ufọdu n’ugwu Juda, wu kwa ulo uku na ulo-elu n’oké ọhia.

5 Onye ahu buso-kwa-ra eze umu Amon agha, we ka ha ike. Umu Amon we nye ya n’arọ ahu ọgu talent ọla-ọcha ise, na orú nnù cor ọka wheat na nnù ise, na orú nnù cor ọka barley na nnù ise. Nka ka umu Amon nyeghachiri ya, n’arọ nke-abua kwa, na n’arọ nke-atọ.

6 Jotam we me onwe-ya ka ọ di ike, n’ihi na o doziri uzọ-ya nile n’iru Jehova, bú Chineke-ya.

7 Ma ihe nile nke Jotam mere nke fọduru, na agha-ya nile, na uzọ-ya nile, le, edewo ha n’akwukwọ ndi-eze Israel na Juda.

8 Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem.

9 Jotam we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, ha we lìe ya n’obodo Devid: Ehaz nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 28

1 Orú arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n’anya Jehova, dika Devid nna-ya:

2 kama o jere ije n’uzọ nile nke ndi-eze Israel, ọzọ kwa, o mere arusi awuru awu nye Bealim.

3 Onye ahu sure-kwa-ra ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ nime ndagwurugwu nwa Hinom, sure kwa umu-ya n’ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n’iru umu Israel.

4 Ọ chua aja, sure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe nile di elu, na n’elu ugwu ntà nile, na n’okpuru osisi ndu ọ bula.

5 Jehova, bú Chineke-ya, we nye ya n’aka eze Siria; ha we tib͕ue ya, si nime ndi-ya dọta ndọta-n’agha uku, me ka ha biarue Damaskọs. Ọzọ kwa, n’aka eze Israel ka enyere ya, o we tib͕ue ya oké ntib͕u.

6 Peka nwa Remalaia b͕uru nime Juda orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise n’otù ubọchi, ha nile bu ndi-dìnkpà; n’ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

7 Zikri, bú dike nke Efraim, we b͕ue Maaseia nwa eze, na Azrikam, bú onye-ndú nke ulo, na Elkena nke bu-kwa-ra eze dika onye nke-abua.

8 Umu Israel we dọta n’agha nime umu-nne-ha orú nnù madu orú uzọ na uzọ ise, bú ndinyom, na umu-ndikom, na umu-ndinyom, ọzọ kwa, ọtutu ihe-nkwata ka ha lutara n’aka-ha n’agha, ha we webata ihe-nkwata ahu na Sameria.

9 Ma otù onye-amuma Jehova nọ n’ebe ahu, Oded bu aha-ya: ọ pua izute usu-ndi-agha ahu nke nābiaru Sameria, ọ si ha, Le, ọ bu n’ihi na Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, kosara Juda ọnuma, ka O nyere ha n’aka-unu, unu we were ọnuma nke ruru elu-igwe b͕ue ha.

10 Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gāzọda umu Juda na Jerusalem ka ha ghọrọ unu ndi-orù na ndinyom nēje ozi: ma unu onwe-unu, ìhe ikpe-ọmuma adighi kwa n’etiti unu n’ebe Jehova, bú Chineke-unu, nọ?

11 Ma ub͕u a nurunum, zighachi ndọta-n’agha ahu, nke unu dọtara n’agha site n’umu-nne-unu: n’ihi na iwe di ọku nke Jehova di n’aru unu.

12 Ndikom ufọdu nime ndi-isi umu Efraim, bú Azaraia nwa Jehohanan, na Berekaia nwa Meshilemot, na Jehizkia na Shalum, na Amasa nwa Hadlai, we bilie imegide ndi nēsi n’usu-ndi-agha bia,

13 ha we si ha, Unu agaghi-ewebata ndọta-n’agha ahu n’ebe a: n’ihi na tukwasi ikpe-ọmuma Jehova nke mara ayi, unu onwe-unu nāsi na unu gātukwasi ihe na nmehie nile ayi na n’ikpe-ọmuma-ayi: n’ihi na o riri nne, bú ikpe-ọmuma mara ayi, iwe di ọku di kwa n’aru Israel.

14 Ndi ejikere agha we rapu ndọta-n’agha ahu na ihe-nluta-n’agha ahu n’iru ndi-isi na nkpọkọta ahu nile.

15 Ndikom ahu ndi akpọrọ n’aha n’aha we bilie, jide ndọta-n’agha ahu, yikwasi ndi-ha b͕ara ọtọ uwe site n’ihe-nkwata ahu, ha we yikwasi ha uwe, yikwasi kwa ha akpukpọ-ukwu, me ha ka ha rie ihe, me kwa ha ka ha ṅua ihe-ọṅuṅu, te ha manu, nēdu ha n’elu inyinya-ibu, bú onye ọ bula nāsu ngọngọ, ha we me ka ha biarue Jeriko, bú obodo ukwu, di umu-nne-ha nso: ha we laghachi na Sameria.

16 Na mb͕e ahu ka eze, bú Ehaz, zigara ndi-eze Asiria ozi ka ha yere ya aka.

17 Ndi Edom bia-kwa-ra ọzọ tib͕ue Juda, we dọta ndọta-n’agha n’agha.

18 Ndi Filistia batakwara n’obodo nile nke ebe di ala ala, na nke Negeb nke diri Juda, ha were kwa Bet-shemesh, na Ajalon, na Gedirot, na Soko na umu-obodo-ya, na Timna na umu-obodo-ya, na Gimzo na umu-obodo-ya: ha we biri n’ebe ahu.

19 N’ihi na Jehova mere ka Juda ruru ala, n’ihi Ehaz, bú eze Israel; n’ihi na o mere ka Juda ghara idi nchikọta, o we mekpu emekpu nke-uku megide Jehova.

20 Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, we biakute ya, kpab͕ue ya, ma o meghi ya ka ọ di ike.

21 N’ihi na Ehaz kère ulo Jehova, na ulo eze na ndi-isi, nye eze Asiria òkè: ma ọ bughi ihe yere ya aka.

22 Ma na mb͕e nkpab͕u ahu akpab͕uru ya, o mekpuru emekpu kari imegide Jehova, bú eze Ehaz nka.

23 O we chuara chi nile nke Damaskọs àjà, bú ndi tib͕uru ya: ọ si, N’ihi na chi nke ndi-eze Siria nēyere ha aka, ndi ahu ka m’gāchuru àjà, ka ha we yerem aka. Ma chi ahu buru ya, bu-kwa-ra Isarel nile, ihe mere ka ọ su ngọngọ.

24 Ehaz we chikọta ihe nile nke ulo Chineke, b͕u ngwongwo ihe nile nke ulo Chineke, mechie ọnu-uzọ nile nke ulo Jehova, mere onwe-ya ebe-ichu-àjà di iche iche nime nkuku nile nime Jerusalem.

25 N’obodo nile ọ bula nke Juda ka o me-kwa-ra ebe di elu isurere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, o we kpasue Jehova, bú Chineke nke nna-ya-hà, iwe.

26 Ma ihe nile o mere nke fọduru, na uzọ-ya nile, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n’akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.

27 Ehaz we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, ha we lìe ya n’obodo ahu, bú nime Jerusalem; ma ha ebubataghi ya n’ílì ndi-eze Israel: Hezekaia nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 29

1 Hezekaia malitere ibu eze mb͕e ọ b͕ara orú arọ na ise; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Abaija nwa-nwayi Zekaraia.

2 O me ihe ziri ezi n’anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.

3 Onye ahu, n’arọ mbu nke ọ bu eze, n’ọnwa mbu, o meghere uzọ ulo Jehova, me ka ha di ike.

4 O we me ka ndi-nchu-àjà na ndi Livai bata, o we chikọbata ha n’amá ọwuwa-anyanwu,

5 si ha, Nurunum, ndi Livai; ub͕u a donu onwe-unu nsọ, do kwa ulo Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, nsọ, me ka idi na nsọ-unu pua n’ebe nsọ ahu.

6 N’ihi na nna-ayi-hà mekpuru emekpu, me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, bú Chineke-ayi, ha we rapu Ya, si n’ebe-obibi Jehova chigharia iru-ha, b͕akuta azu-ha.

7 Ọzọ, ha emechiwo ọnu-uzọ nile nke uzọ-nbata, menyu oriọna nile, ha esureghi kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha esureghi kwa àjà-nsure-ọku, n’ebe nsọ ahu, nye Chineke Israel.

8 Iwe Jehova we dikwasi Juda na Jerusalem, O we rara ha nye ka ha buru ihe-nkwaghari, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, dika unu onwe-unu nēwere anya-unu hu.

9 Ma, le, nna-ayi-hà adawo site na mma-agha, umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ndinyom-ayi nọ na ndọta-n’agha n’ihi nka.

10 Ub͕u a ọ di n’obim ka ayi na Jehova, bú Chineke Israel, b͕a ndu, ka iwe-Ya nke di ọku we si n’ebe ayi nọ chigharia.

11 Umum, ub͕u a unu ejehiela: n’ihi na ọ bu unu ka Jehova rọputara iguzo n’iru Ya, ijere Ya ozi, na iburu Ya ndi nēje ozi na ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

12 Ndi Livai we bilie, bú Mehat nwa Amasai, na Joel mwa Azaraia, ndi sitere n’umu ndi Kohat: na Kish nwa Abdi, na Azaraia nwa Jehalelel, ndi sitere n’umu Merari: na Joa nwa Zima, na Iden nwa Joa, ndi sitere na ndi Giashon:

13 na Shimri na Jeuel, ndi sitere n’umu Elizafan: na Zekaraia na Matanaia, ndi sitere n’umu Esaf:

14 na Jehuel na Shimai, ndi sitere n’umu Himan: na Shemaia na Uziel, ndi sitere n’umu Jedutum.

15 Ha we chikọta umu-nne-ha ndikom, do onwe-ha nsọ, ba, dika ihe ahu si di nke eze nyere n’iwu, site n’okwu, ime ka ulo Jehova di ọcha.

16 Ndi-nchu-àjà we ba n’ime-ime nke ulo Jehova, ime ka o di ọcha, ha we buputa ihe ruru árú nile nke ha chọtara n’ulo uku Jehova tiye ya n’ogige ulo Jehova. Ndi Livai we nara ya, ibupu ya je miri-iyi Kidron n’èzí.

17 Ha we malite ido nsọ n’ubọchi mbu nke ọnwa mbu, n’ubọchi nke-asatọ nke ọnwa ka ha biaruru uzọ-nbata Jehova; ha we do ulo Jehova nsọ n’ubọchi asatọ: ọ bu kwa n’ubọchi nke-iri-na-isi nke ọnwa mbu ka ha dobìri ya nsọ.

18 Ha we ba nime biakute Hezekaia, bú eze, si, Ayi emewo ka ulo Jehova nile di ọcha, ya na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, na ihe-ya nile, na Table achicha anēdo n’usoro, na ihe-ya nile.

19 Ihe nile kwa nke eze, bú Ehaz, juru aju mb͕e ọ bu eze mb͕e o mekpuru emekpu, ndia ka ayi doziworo, do kwa nsọ; ma, le, ha di n’iru ebe-ichu-àjà Jehova.

20 Hezekaia, bú eze, we bilie n’isi-ututu, chikọta ndi-isi obodo, rigorue ulo Jehova.

21 Ha we webata oke-ehi asa, na ebulu asa, na umu-aturu asa, na nkpi asa, ibu àjà-nmehie n’ihi ala-eze, na n’ihi ebe nsọ ahu, na n’ihi Juda. Ọ si umu Eron, bú ndi-nchu-àjà, ka ha sure ha ọku n’elu abe-ichu-àjà Jehova.

22 Ha we b͕ue oke-ehi asa ahu, ndi-nchu-àjà we nara ọbara-ha, wusa n’ebe-ichu-àjà: ha b͕u-kwa-ra ebulu asa ahu, wusa ọbara-ha n’ebe-ichu-àjà: ha b͕u-kwa-ra umu-aturu ahu, wusa ọbara-ha n’ebe-ichu-àjà.

23 Ha we weta nkpi asa nke àjà-nmehie nso n’iru eze na nkpọkọta Juda; ha we bikwasi ha aka-ha:

24 ndi-nchu-àjà we b͕ue ha, were ọbara-ha chua àjà-nmehie n’ebe-ichu-àjà, ikpuchiri Israel nile nmehie: n’ihi na eze siri, Ọ diri Israel nile, bú àjà-nsure-ọku a na àjà-nmehie a.

25 O we guzo ndi Livai n’ulo Jehova, ndi chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, dika ihe ahu si di nke Devid, na Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke eze, na Netan, bú onye-amuma, nyere n’iwu: n’ihi na o sitere n’aka Jehova, bú ihe ahu enyere n’iwu, site n’aka ndi-amuma-Ya.

26 Ndi Livai we chiri ihe Devid guzo, ndi-nchu-àjà chiri kwa opì.

27 Hezekaia we si ka esure àjà-nsure-ọku n’ebe-ichu-àjà. Ma na mb͕e amalitere isure àjà-nsure-ọku, amalitere ibù abù Jehova, na ifù opì nile, na ikpọ ihe nile bu ubọ nke Devid, bú eze Israel.

28 Nkpọkọta ahu nile nākpọ kwa isi ala, ndi-ọbù-abù nābù kwa, ndi nāfù opì nāfù kwa: anēme ihe a nile rue mb͕e achubìri àjà-nsure-ọku.

29 Ma mb͕e ha surebìsiri àjà-nsure-ọku, eze na ndi nile ahuru n’ebe ọ nọ ruru ala, we kpọ isi ala.

30 Hezekaia, bú eze, na ndi-isi we si ndi Livai ka ha were okwu nke Devid, na nke Esaf, bú onye-ọhu-uzọ, to Jehova. Ha we to Chineke rue ọṅù, ha we rube isi kpọ isi ala.

31 Hezekaia we za, si, Ub͕u a unu emejuwo aka-unu n’ebe Jehova nọ, bianu nso webata àjà na àjà-ekele n’ulo Jehova. Nkpọkọta Juda we webata àjà na àjà-ekele; onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo weta-kwa-ra àjà-nsure-ọku.

32 Ọnu-ọgugu àjà-nsure-ọku, nke nkpọkọta Juda wetara, we di ọgu oke-ehi atọ na iri, na ọgu ebulu ise, na ọgu umu-aturu iri: ndia nile bu ihe àjà-nsure-ọku ichuru Jehova.

33 Ihe edoro nsọ di kwa nnù oke-ehi na ọgu iri, na nnù aturu asa na ọgu iri.

34 Nání na ndi-nchu-àjà di ole-na-ole, ha apughi kwa ib͕a akpukpọ anu àjà-nsure-ọku nile: umu-nne-ha, bú ndi Livai, we me ka ha di ike, rue mb͕e ejebìri ozi ahu, ru kwa mb͕e ndi-nchu-àjà doro onwe-ha nsọ: n’ihi na ndi Livai nwere obi ziri ezi kari ndi-nchu-àjà ido onwe-ha nsọ.

35 Ọzọ kwa, àjà-nsure-ọku bara uba, tiyere abuba nke àjà-udo nile, tiye-kwa-ra àjà-ihe-ọṅuṅu nile nke diri àjà-nsure-ọku. Ewe dozie òfùfè ulo Jehova.

36 Hezekaia we ṅuria, ya na ndi-ya nile, n’ihi ihe nke Chineke doziri nye ndi ahu: n’ihi na ọ bu na mberede ka ihe a mere.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 30

1 Hezekaia we zigara Israel na Juda nile ozi, ọzọ kwa, o degara Efraim na Manase akwukwọ-ozi, ka ha biarue ulo Jehova nime Jerusalem, imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga.

2 Eze we nara idu-ọdu, ya na ndi-isi-ya, na nkpọkọta Juda nile nime Jerusalem, ime ememe ngabiga n’ọnwa nke-abua.

3 N’ihi na ha apughi ime ya na mb͕e ahu, n’ihi na ndi-nchu-àjà adoghi onwe-ha nsọ n’ọnu-ọgugu nke gēzuru ihe ahu, ndi Israel achikọtaghi kwa onwe-ha biarue Jerusalem.

4 Ihe a ziri ezi n’anya eze ma n’anya nkpọkọta Israel nile.

5 Ha we guzo okwu a, ikwusa n’Israel nile, site na Bia-sheba we rue Dan, ka ha bia imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga nime Jerusalem: n’ihi na ha emeghi ya dika edeworo ya n’akwukwọ n’ọtutu mb͕e gara aga.

6 Ndi-ọb͕a-ọsọ we were akwukwọ-ozi sitere n’aka eze na ndi-isi-ya jeghari n’Israel na Juda nile, na dika ihe eze nyere n’iwu si di, si, Umu Israel, laghachikutenu Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka O we laghachikuru ndi b͕apuru ab͕apu ndi fọduru unu site n’aka ndi-eze Asiria.

7 Unu adi-kwa-la ka nna-unu-hà, na dika umu-nne-unu, ndi mekpuru emekpu megide Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, O we rara ha nye ibu ihe-iju-anya, dika unu onwe-unu nāhu.

8 Ub͕u a unu ekwesila olu-unu ike, dika nna-unu-hà mere; ma nyenu Jehova aka-unu, ba n’ebe nsọ Ya, nke O doworo nsọ rue mb͕e ebighi-ebi, fè-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, òfùfè, ka iwe-Ya nke di ọku we si n’ebe unu nọ chigharia.

9 N’ihi na asi na unu alaghachikute Jehova, agēnwe obi-ebere n’aru umu-nne-unu na umu-unu n’iru ndi adọtara ha n’agha, ha gābiaghachi kwa n’ala nka: n’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, nēme amara, nwe kwa obi-ebere, Ọ gaghi-esi kwa n’ebe unu nọ wezuga iru-Ya, ọ buru na unu alaghachikute Ya.

10 Ndi-ọb͕a-ọsọ ahu we nāgabiga site n’obodo rue obodo n’ala Efraim na Manase, we rue Zebulun: ha we nāchì ha ọchì, lelì kwa ha anya.

11 Otú ọ di, ndikom ufọdu ndi sitere n’Asha na Manase, site kwa na Zebulun, ruru ala, we bia Jerusalem.

12 Aka Chineke di kwa na Juda inye ha otù obi, ime ihe eze na ndi-isi nyere n’iwu site n’okwu Jehova.

13 Ewe chikọta ndi bara uba nime Jerusalem ime ememe achicha ekoghi-eko n’ọnwa nke-abua, bú nkpọkọta bara uba nke-uku.

14 Ha we bilie wezuga ebe-ichu-àjà nile nke di na Jerusalem, ha wezuga-kwa-ra ebe nile nke isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha we kpofue ha nime miri-iyi Kidron.

15 Ha we b͕ue anu ngabiga n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nke-abua: ma ihere mere ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ha we do onwe-ha nsọ, webata àjà-nsure-ọku n’ulo Jehova.

16 Ha we guzo n’ebe-nguzo-ha, dika ikpé-ha si di, dika iwu Moses, bú onye nke Chineke, si di: ndi-nchu-àjà nāwusa ọbara nke ha natara n’aka ndi Livai.

17 N’ihi na ha bara uba nime nkpọkọta ahu, bú ndi nēdoghi onwe-ha nsọ: ndi Livai we buru ndi-isi n’ib͕uru onye ọ bula nādighi ọcha anu ngabiga, ido ha nsọ nye Jehova.

18 N’ihi na ọtutu ndi Israel, bú ọtutu ndi sitere n’Efraim na Manase na Isaka na Zebulun, emeghi onwe-ha ka ha di ọcha, kama ha riri oriri ngabiga otú anēdeghi ya n’akwụkwọ. Ma Hezekaia kpere ekpere bayere ha, si, Ka Jehova, bú ezi Onye ahu, kpuchiere onye ọ bula nmehie-ya,

19 bú onye doziworo obi-ya ichọ Chineke, bú Jehova, Chineke nke nna-ya-hà, ọ bu ezie na emeghi ka ọ di ọcha dika ime-ka-adi-ọcha nke ebe nsọ ayi si di.

20 Jehova we ge Hezekaia nti, me ka ndi Israel diri ndu.

21 Umu Israel ndi ahuru nime Jerusalem we me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa n’ọṅù uku: ndi Livai na ndi-nchu-àjà nēto kwa Jehova kwa-ubọchi, chiri ihe nādasi udà ike nēto Jehova.

22 Hezekaia we gwa ndi Livai nile okwu nābà ha n’obi, bú ndi nwere ezi uche bayere Jehova. Ha we rie ihe ahu akara àkà ubọchi asa ahu, nāchu àjà, bú àjà-udo, nēkele kwa Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

23 Nkpọkọta ahu nile we nara idu-ọdu ime ememe ubọchi asa ọzọ: ha we were ọṅù me ememe ubọchi asa ọzọ.

24 N’ihi na Hezekaia, bú eze Juda, buliri nye nkpọkọta ahu nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri; ndi-isi buli-kwa-ra nye nkpọkọta ahu nnù oke ēhi abua na ọgu iri, na orú nnù aturu na nnù ise: ndi-nchu-àjà we do onwe-ha nsọ n’uba.

25 Ha we ṅuria, bú nkpọkọta nile nke Juda, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na nkpọkọta nile ndi nēsi n’Israel bia, na ndi-ọbìa ndi nēsi n’ala Israel bia, ndi nēbi kwa na Juda.

26 Ọṅù uku we di na Jerusalem: n’ihi na site n’ubọchi Solomon nwa Devid, bú eze Israel, ihe dika nka adighi nime Jerusalem.

27 Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we bilie gọzie ndi ahu: ewe nu olu-ha, ekpere-ha we biarue ebe-obibi-Ya di nsọ, rue elu-igwe.