Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 11

1 Rehoboam we biarue Jerusalem, kpọkọta ulo Juda na Benjamin, orú nnù ndikom orú uzọ na abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nēbu agha, ibuso Israel agha, iweghachiri Rehoboam ala-eze:

2 Okwu Jehova we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si,

3 Gwa Rehoboam nwa Solomon, bú eze Juda, gwa kwa Israel nile di na Juda na Benjamin, okwu, si,

4 Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu agha: laghachinu, nwoke ọ bula n’ulo-ya; n’ihi na n’ebe M’nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, si n’ije imegide Jeroboam laghachi.

5 Rehoboam we biri na Jerusalem, wue obodo ufọdu ib͕ochi agha nime Juda.

6 O wue Bet-lehem, na Itam, na Tekoa,

7 na Bet-zua, na Soko, na Adulam,

8 na Gat, na Marisha, na Zif,

9 na Adoraim, na Lekish, na Azeka,

10 na Zora, na Ajalon, na Hebron, nke di na Juda na Benjamin, bú obodo ewusiri ike.

11 Ọ we me ka ebe nile ewusiri ike di ike, tiye ndi-ndú nime ha, na àkù, bú ihe-oriri, na manu, na manya-vine.

12 O tiye-kwa-ra ọta na ube n’obodo nile ọ bula, we me ka ha di ike ri nne. O we nwe Juda na Benjamin.

13 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi nọ n’Israel nile we si n’ókè-ala-ha nile guzo onwe-ha n’akuku ya.

14 N’ihi na ndi Livai rapuru ebe-ita-nri-anu nile ha na ihe-onwunwe-ha, we jerue Juda, jeru kwa Jerusalem: n’ihi na Jeroboam na umu-ya ndikom juru ha, ka ha ghara iburu Jehova ndi-nchu-àjà:

15 ọ we guzoro onwe-ya ndi-nchu-àjà idiri ebe di elu, na idiri nkpi, na idiri umu-ehi, nke o mere.

16 Site n’ebo nile nke Israel ndi nēnye obi-ha ichọ Jehova, bú Chineke Israel, so-kwa-ra ha bia na Jerusalem ichuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, àjà.

17 Ha we me ka ala-eze Juda di ike, ha b͕a kwa Rehoboam nwa Solomon ume, arọ atọ: n’ihi na ha jere ije n’uzọ Devid na Solomon arọ atọ.

18 Rehoboam we lutara onwe-ya nwunye, bú Mahalat nwa-nwayi Jerimot nwa Devid, na Abihail nwa-nwayi Elaiab nwa Jesi,

19 o we muara ya umu-ndikom; Jeush, na Shemaria, na Zaham.

20 Mb͕e ọ lusiri ya ọ luta-kwa-ra Meaka nwa-nwayi Absalom; o we muara ya Abaija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.

21 Rehoboam we hu Meaka nwa Absalom n’anya kari ndinyom-ya nile na iko-ya ndinyom nile: (n’ihi na ndinyom iri na asatọ ka ọ lutara, nwe kwa ọgu iko-ndinyom atọ, o we mua orú umu-ndikom na asatọ na ọgu umu-ndinyom atọ).

22 Rehoboam we guzo Abaija nwa Meaka ibu onye-isi, ọbuná ibu onye-ndú n’etiti umu-nne-ya: n’ihi na ọ di n’obi-ya ime ya eze.

23 O nwe-kwa-ra nghọta, we me ka ufọdu nime umu-ya ndikom nile b͕asa rue ala nile nke Juda na Benjamin, rue obodo ọ bula ewusiri ike: o we nye ha nri n’uba. O we chọ ìgwè ndinyom.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 12

1 O rue, mb͕e emere ka ala-eze Rehoboam guzosie ike, mb͕e ọ di kwa ike, na ọ rapuru iwu Jehova, ya na Israel nile.

2 O rue n’arọ nke-ise nke eze, bú Rehoboam, na Shaishak, bú eze Ijipt, rigotara imegide Jerusalem, (ọ bu n’ihi na ha mekpuru emekpu megide Jehova,)

3 ya na nnù ub͕ọ-ala atọ na orú nnù ndi-inyinya uzọ asa na nnù iri: ndi soro ya si n’Ijipt bia enweghi kwa ọnu-ọgugu; bú ndi-Lubim, na ndi-Sukim, na ndi Etiopia.

4 O we were obodo nile ewusiri ike nke Juda nwere, we biarue Jerusalem.

5 Ma Shemaia, bú onye-amuma, biakutere Rehoboam na ndi-isi Juda, ndi achikọtara rue Jerusalem n’ihi Shaishak, ọ si ha, Otú a ka Jehova siri, Unu onwe-unu arapuwom, ọzọ kwa, Mu onwem arapuwo unu n’aka Shaishak.

6 Ndi-isi Israel na eze we weda onwe-ha n’ala, si, Onye ezi omume ka Jehova bu.

7 Ma mb͕e Jehova huru na ha wedara onwe-ha n’ala, okwu Jehova ruru Shemaia nti, si, Ha ewedawo onwe-ha n’ala; M’gaghi-ebibi ha: kama M’gēnye ha nb͕apu na mb͕e ntà, agaghi-awusi kwa ọnumam na Jerusalem site n’aka Shaishak.

8 Otú ọ di, ha gāburu ya orù; ka ha we mara òfùfèm, na òfùfè ala-eze nke ala ọzọ.

9 Shaishak, bú eze Ijipt, we rigota imegide Jerusalem, we wepu àkù nile nke ulo Jehova na àkù nile nke ulo eze; ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere.

10 Eze, bú Rehoboam, we me ọta ọla n’ọnọdu ha, nye ha n’aka ndi-isi ndi-ọb͕a-ọsọ, bú ndi nēche ọnu-uzọ ulo eze, ka ha lekọta ha anya.

11 O rue, mb͕e ọ bula eze nābà n’ulo Jehova, na ndi-ọb͕a-ọsọ biara we būru ha, bughachi kwa ha n’ime-ulo ndi-ọb͕a-ọsọ.

12 Ma mb͕e o wedara onwe-ya n’ala, iwe Jehova siri n’aru ya chigharia, O we ghara ibibizu ya: ọzọ kwa, ezi ihe ufọdu di na Juda.

13 Eze, bú Rehoboam, we me onwe-ya ka ọ di ike na Jerusalem, o we buru eze: n’ihi na Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri-na-asa na Jerusalem, bú obodo ahu nke Jehova rọputara n’ebo nile nke Israel, ido aha-Ya n’ebe ahu: aha nne-ya bu Neama nwayi Amon.

14 O we me ihe ọjọ, n’ihi na o dozighi obi-ya ichọ Jehova.

15 Ma ihe nile Rehoboam mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere nke Shemaia, bú onye-amuma, na n’akwukwọ Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere akwukwọ-osuso-ọmumu? Ma agha di n’etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile.

16 Rehoboam we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’obodo Devid: Abaija nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 13

1 N’arọ nke iri-na-asatọ nke eze, bú Jeroboam, ka Abaija malitere ibu eze Juda.

2 Arọ atọ ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Maikaīa nwa-nwayi Uriel nke Gibea. Agha di kwa n’etiti Abaija na Jeroboam.

3 Abaija we were usu-ndi-agha, bú ndi-dike n’agha, bū agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri, bú ndi arọputara arọputa: ma Jeroboam were orú nnù ndikom ọgu uzọ ise, bú ndi arọputara arọputa, do agha n’usoro imegide ya, ha bu ndi-dike bu dìnkpà.

4 Abaija we bilie n’elu ugwu Zemaraim, nke di n’ugwu Efraim, si, Nurunum, Jeroboam na Israel nile;

5 ọ̀ bughi ọlu-unu imara na Jehova, bú Chineke Israel, nyere Devid ala-eze ibu onye-isi Israel rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná ya na umu-ya, n’ọb͕ub͕a-ndu nnú?

6 Ma Jeroboam nwa Nebat, bú orù Solomon nwa Devid, ebiliwo, we nupu isi imegide onye-nwe-ya.

7 Ndikom efu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we chikọta onwe-ha n’ebe ọ nọ, b͕a onwe-ha ume imegide Rehoboam nwa Solomon, ma Rehoboam bu nwata di kwa nrò n’obi, o meghi kwa onwe-ya ka ọ di ike n’iru ha.

8 Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gēme onwe-unu ka unu di ike n’iru ala-eze Jehova n’aka umu Devid; unu onwe-unu bu kwa ìgwè bara uba, n’etiti unu ka umu-ehi ọla-edo di kwa, bú nke Jeroboam mere nye unu ibu chi.

9 Ùnu akwapughi ndi-nchu-àjà Jehova, bú umu Eron, na ndi Livai, mere onwe-unu ndi-nchu-àjà dika ndi ala ọzọ nēme? onye ọ bula nke nābia iwere nwa oke-ehi na ebulu asa meju aka-ya, ọ gāghọ-kwa-ra ndi nābughi Chineke onye-nchu-àjà.

10 Ma ayi onwe-ayi, Jehova bu Chineke-ayi, ayi arapughi kwa Ya; ndi-nchu-àjà nēje-kwa-ra Jehova ozi, bú umu Eron, ndi Livai nọ kwa n’ije-ozi-ha:

11 ha nēsure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ kwa-ututu kwa-anyasi, ya na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda di iche iche me: achicha edoro n’usoro di kwa n’elu table ahu di ọcha: ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna-ya nile di kwa, inwu enwu kwa-anyasi: n’ihi na ayi onwe-ayi nēdebe ihe-ndebe Jehova, bú Chineke-ayi; ma unu onwe-unu arapuwo Ya.

12 Ma, le, Chineke nọyere ayi, dika onye-isi-ayi, Ya na ndi-nchu-àjà-Ya, ndi chiri opì ahu, bú nke eji fù ka ha we dasie udà ike, ifù ha ka ha we dasie uda ike megide unu. Umu Israel, unu ebusola Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, agha; n’ihi na ọ gaghi-agara unu nke-ọma.

13 Ma Jeroboam mere ka ndi nēru nbì b͕a buruburu ibia n’azu ha: ha we di n’iru Juda, ma ndi nēru nbì di n’azu ha.

14 Juda we le anya n’azu, ma, le, anēbuso ha agha n’iru na azu: ha we tikue Jehova nkpu, ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì.

15 Ndikom Juda we tie nkpu: o rue, mb͕e ndikom Juda tiri nkpu, na Chineke tib͕uru Jeroboam na Israel nile n’iru Abaija na Juda.

16 Umu Israel we si n’iru Juda b͕alaga: Chineke we nye ha n’aka-ha.

17 Abaija na ndi-ya we tib͕ue ha ọtutu ntib͕u: orú nnù ndi eb͕uru eb͕u ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, we dapu n’Israel.

18 Ewe weda umu Israel n’ala na mb͕e ahu, umu Juda we b͕a ume, n’ihi na ha dabere na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

19 Abaija we chuso Jeroboam, nara ya obodo, bú Bet-el na umu-obodo-ya, na Jeshana na umu-obodo-ya, na Efron na umu-obodo-ya.

20 Jeroboam enweghi kwa ike ọzọ n’ubọchi Abaija: Jehova we tib͕ue ya, o we nwua.

21 Abaija we me onwe-ya ka ọ di ike, o we lutara onwe-ya ndinyom iri na anọ, mua orú umu-ndikom na abua, na umu-ndinyom iri na isi.

22 Ma ihe nile Abaija mere nke fọduru, na uzọ-ya nile, na okwu-ya nile, edewo ha n’akukọ Ido, bú onye-amuma.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 14

1 Abaija we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, ha we lìe ya n’obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya: ala di jū n’ubọchi-ya arọ iri.

2 Esa we me ezi ihe nke zi-kwa-ra ezi n’anya Jehova, bú Chineke-ya:

3 o we wezuga ebe-ichu-àjà nile nke ala ọzọ, na ebe nile di elu, tupia ogidi nile, b͕utue Asherim;

4 ọ si Juda ka ha chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, na ime iwu na ihe enyere n’iwu.

5 O si-kwa-ra n’obodo nile nke Juda wezuga ebe nile di elu na arusi-anyanwu nile: ala-eze-ya we di jū n’iru ya.

6 O we wue obodo ewusiri ike nime Juda: n’ihi na ala di jū, ọ dighi kwa agha o nwere n’arọ ndia; n’ihi na Jehova mere ka o zuru ike.

7 O we si Juda, Ka ayi wue obodo ndia, were mb͕idi, na ulo-elu, na ibo-ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ b͕a ha buruburu; ala-ayi di n’iru ayi rue ub͕u a, n’ihi na ayi achọwo Jehova, bú Chineke-ayi; ayi achọwo Ya, O we me ka ayi zuru ike buruburu. Ha we wue, ihe we gara ha nke-ọma.

8 Esa nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu ọta uku na ube, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri ndi sitere na Juda; na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise ndi sitere na Benjamin, bú ndi nēbu ọta, nāzọgide kwa uta ikwe ha: ndia nile bu ndi-dike bu dìnkpà.

9 Zera, bú onye Etiopia, we chiri usu-ndi-agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ ise, na ọgu ub͕ọ-ala iri-na-ise, pukute ha; o we biarue Marisha.

10 Esa we pua izute ya, ha we do agha n’usoro nime ndagwuruguru Zefata nime Marisha.

11 Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n’etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n’ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n’aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi.

12 Jehova we tib͕ue ndi Etiopia n’iru Esa, na n’iru Juda; ndi Etiopia we b͕alaga.

13 Esa na ndi ya na ha nọ we chua ha rue Gera: ọtutu nime ndi Etiopia we da, idebe-ndu we ghara idiri ha; n’ihi na etipiara ha n’iru Jehova na n’iru ọmuma-ulo-ikwū-Ya; ha we būru ihe-nkwata nke bara uba nke-uku.

14 Ha we tib͕ue obodo nile di Gera buruburu; n’ihi na oké egwu nke Jehova dakwasiri ha: ha we luta ihe obodo nile n’agha; n’ihi na ọtutu ihe-nluta-n’agha di nime ha.

15 Ọzọ kwa, ha tib͕uru ndi ulo-ikwū nke anu-ulo, we chiri n’agha ìgwè ewu na aturu n’uba na camel, lata na Jerusalem.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 15

1 Mọ nke Chineke we dakwasi Azaraia nwa Oded:

2 o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu.

3 Ma ọtutu ubọchi ka Israel nọ nēnweghi Chineke nke ezi-okwu, nēnweghi kwa onye-nchu-àjà nēzí ihe, nēnweghi kwa iwu:

4 ha we chigharikute Jehova, bú Chineke Israel, nime nkpab͕u diri ha, we chọ Ya, O we me ka ha chọta Ya.

5 Ma na mb͕e ahu ọ dighi udo diri onye nāpu apu, ma-ọbu diri onye nābata abata, kama ọtutu ib͕a-aghara dikwasiri ndi nile bi n’ala ahu nile.

6 Ewe tipia ha, mba megide mba, na obodo megide obodo: n’ihi na Chineke were nkpab͕u nile chusa ha.

7 Ma unu onwe-unu, dinu ike, ekwela ka aka-unu kuda: n’ihi na ugwọ-ọlu diri ọlu-unu.

8 Ma mb͕e Esa nuru okwu ndia, na obubu-amuma nke Oded, bú onye-amuma, o mere onwe-ya ka ọ di ike, we me ka ihe-árú nile si n’ala Juda na Benjamin nile, si kwa n’obodo nile nke ọ naputara n’ugwu Efraim, gabiga; o me kwa ka ebe-ichu-àjà Jehova di ọhu, bú nke di n’iru uzọ-nbata Jehova.

9 Ọ chikọta Juda na Benjamin nile, na ndi nānọ dika ọbìa n’etiti ha site n’Efraim na Manase, site kwa na Simeon: n’ihi na ha siri n’Israel dayere ya n’uba, mb͕e ha huru na Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya.

10 Ha we chikọta onwe-ha nime Jerusalem n’ọnwa nke-atọ, n’arọ nke-iri-na-ise nke Esa bu eze.

11 Ha we chuara Jehova àjà n’ubọchi ahu, site n’ihe-nkwata ha bubatara, bú nnù ehi na ọgu iri-na-ise, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri.

12 Ha we ba nime ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú iwere obi-ha nile na nkpuru-obi-ha nile chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha;

13 na ime ka onye ọ bula nwua, ma ọ bu onye ntà ma-ọbu onye uku, ma-ọbu nwoke ma-ọbu nwayi, nke nāchọghi Jehova, bú Chineke Israel.

14 Ha we were oké olu, were kwa iti-nkpu, were kwa opì, were kwa opì-ike, ṅuara Jehova iyi.

15 Juda nile we ṅuria ọṅu n’ọṅuṅu-iyi ahu: n’ihi na ha were obi-ha nile ṅua iyi, were kwa otú ọ nātọzu ha utọ chọ Ya; O we me ka ha chọta Ya: Jehova we me ka ha zuru ike buruburu.

16 Ọzọ kwa, Meaka nne Esa, bú eze, o wezugara ya n’ibu eze-nwayi, n’ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, ọ supia ya, sure ya ọku na miri-iyi Kidron.

17 Ma esighi n’Israel wezuga ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n’ubọchi-ya nile.

18 Ọ chibata n’ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ.

19 Agha adighi kwa ọzọ rue arọ nke-orú-na-iri-na-ise nke Esa bu eze.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 16

1 N’arọ nke-orú-na-iri-na-isi nke Esa bu eze, Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata.

2 Esa we weputa ọla-ọcha na ọla-edo n’àkù ulo Jehova na nke ulo eze, zigara Ben-hedad, bú eze Siria, onye bi na Damaskọs, si,

3 Ọb͕ub͕a-ndu di n’etiti mu na gi, na n’etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom i ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n’arum rigo.

4 Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel; ha we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-maim, na ulo-nchikọbata-ihe nile nke obodo Naftali nile.

5 O rue, mb͕e Beasha nuru ya, na ọ rapuru iwu Rema, me ka ozi-ya ahu kwusi.

6 Ma Esa, bú eze, chiri Juda nile; ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; o we were ha wue Geba na Mizpa’

7 Ma na mb͕e ahu Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, biakutere Esa, bú eze Juda, si ya, N’ihi na i dabeworo n’eze Siria, ma i dabeghi na Jehova, bú Chineke-gi, n’ihi nka usu-ndi-agha eze Siria esiwo n’aka-gi wepuga onwe-ya.

8 Ndi Etiopia na ndi-Lubim, hà abughi usu-ndi-agha n’uba, nēnwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya bara uba nke-uku? ma mb͕e i dabere na Jehova, O nyere ha n’aka-gi.

9 N’ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n’uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n’akuku ndi obi-ha zuru okè n’ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n’ihi na site n’ub͕u a i gēnwe agha.

10 Esa we wesa onye-ọhu-uzọ ahu iwe, tiye ya n’ulo ọtọsi; n’ihi na o nēkosa ya ọnuma n’ihi ihe a. Esa we zọpia ufọdu nime ndi-ya na mb͕e ahu.

11 Ma, le, ihe nile Esa mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n’akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.

12 Esa we ria ọria n’ukwu-ya abua n’arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete ọ bu eze; ọria-ya di uku ri nne: ọzọ kwa, n’ọria-ya ọ chọghi Jehova, kama ọ chọrọ n’etiti ndi-dibia.

13 Esa we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, ọ nwua n’arọ nke-ọgu-abua-na-otú ọ bu eze.

14 Ha we lìe ya n’ili ya, nke o gwuwara nye onwe-ya n’obodo Devid, ha we me ka o dina n’ihe-ndina nke emejuru n’uda di iche iche na ihe di iche iche asugwara asugwa n’ọlu onye nāsugwa manu nēsì ísì utọ: ha we surere ya oké nsure-ọku di uku.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 17

1 Jehoshafat nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya, we me onwe-ya ka ọ di ike imegide Israel.

2 O we tiye usu-ndi-agha n’obodo nile ewusiri ike nke Juda, o tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n’ala Juda, na n’obodo Efraim nile nke Esa nna-ya were.

3 Jehova we nọyere Jehoshafat, n’ihi na o jere ije n’uzọ mbu Devid, bú nna-ya, ọ chọghi kwa Bealim;

4 kama ọ chọrọ Chineke nke nna-ya, jeghari kwa n’ihe nile O nyere n’iwu, ọ bughi kwa dika omume Israel si di.

5 Jehova we me ka ala-eze guzosie ike n’aka-ya; Juda nile we nye Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma; o we nwe àkù na nsọpuru n’uba.

6 Obi-ya di kwa elu n’uzọ nile nke Jehova: ọzọ kwa, o siri na Juda wezuga ebe nile di elu na Asherim.

7 Ma n’arọ nke-atọ nke ọ bu eze o zigara ndi-isi-ya, bú Ben-hail, na Obadaia, na Zekaraia, na Netanel, na Maikaia, izí ihe n’obodo Juda nile:

8 ha na ndi Livai, bú Shemaia, na Netanaia, na Zebadaia, na Asahel, na Shemiramot, na Jehonatan, na Adonaija, na Tobaija, na Tob-Adonaija, ndi Livai; ha na Elishama na Jehoram, bú ndi-nchu-àjà.

9 Ha we zí ihe na Juda, nēji akwukwọ iwu Jehova n’aka-ha; ha we nēje obodo nile nke Juda buruburu, we nēzí ihe n’etiti ndi Juda.

10 Oké egwu Jehova we dikwasi ala-eze nile nke ala nile nke di Juda buruburu, ha ebusoghi kwa Jehoshafat agha.

11 Ufọdu nime ndi Filistia weta-kwa-ra Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma, na ọla-ọcha òfùfè; ndi Arebia nēweta-kwa-ra ya ìgwè ewu na aturu, nnù ebulu iri-na-iteghete na ọgu ise, na nnù nkpi iri-na-iteghete na ọgu ise.

12 Jehoshafat we nāga n’iru we di ike ri nne; o we wue nime Juda ulo uku na obodo nchikọbata-ihe.

13 O nwe-kwa-ra ije-ozi bara uba n’obodo Juda nile, na ndikom agha nime Jerusalem, ha bu ndi-dike bu dìnkpà.

14 Ma ndia bu ngukọta-ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di: nke Juda, ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri; Adna, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnu iri, ndi-dike bu dìnkpà:

15 onye so ya bu Jehohanan, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise:

16 onye so ya bu Amasaia nwa Zikri, onye were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ya; ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi-dike bu dìnkpà:

17 ndi sitere na Benjamin; otù dike bu dìnkpà, bú Elaiada, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi nāchi uta na ọta:

18 onye so ya bu Jehozabad, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ abua na nnù iri, ndi ejikere nke usu-ndi-agha.

19 Ndia bu ndi nējere eze ozi, nāgughi ndi ahu eze tiyere n’obodo nile ewusiri ike nime Juda nile.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 18

1 Jehoshafat we nwe àkù na nsọpuru n’uba; o we ghọ ọgọ Ehab.

2 Mb͕e arọ ufọdu gwusiri ọ ridakuru Ehab, rue Sameria. Ehab we b͕uere ya aturu na ehi n’uba, b͕u-kwa-ra ndi ya na ha yikọrọ, o we kpalie ya irigoru Remot-gilead.

3 Ehab, bú eze Israel, we si Jehoshafat, bú eze Juda, Ì gēsom je Remot-gilead? Ọ we si ya, Dika m’di, otú a ka i di, ndim di kwa ka ndi-gi; ayi gānọye-kwa-ra gi n’agha ahu.

4 Jehoshafat we si eze Israel, Biko, buru uzọ ju ase okwu Jehova.

5 Eze Israel we chikọta ndi-amuma, bú nnù ndikom, si ha, Àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m’gārapu? Ha we si, Rigo; Chineke gēnye kwa ya n’aka eze.

6 Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n’ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n’aka-ya?

7 Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n’aka-ya: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n’ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama nke ihe ọjọ ubọchi-ya nile: onye ahu bu Maikaia nwa Imla. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a.

8 Eze Israel we kpọ otù onye nēje ozi, si, Me ka Maikaia nwa Imla bia ọsọsọ.

9 Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n’oche-eze-ya, yiri uwe-ha, ha we nọdu n’ebe-nzọcha-ọka n’oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n’iru ha.

10 Zedakaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia.

11 Ndi-amuma nile nēbu kwa amuma otú a, si, Rigorue Remot-gilead, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma: Jehova enyewo kwa ya n’aka eze.

12 Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di kwa ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe.

13 Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n’ezie ihe Chinekem gāsi, nke ahu ka m’gēkwu.

14 O we biakute eze, eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m’gārapu? Ọ si, Rigonu, ka ihe ga-kwa-ra unu nke-ọma; agēnye kwa ha n’aka-unu.

15 Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n’aha Jehova?

16 Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n’ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n’ulo-ya n’udo.

17 Eze Israel we si Jehoshafat, Àsighm i na ọ gaghi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama nke ihe ọjọ?

18 Ọ si, N’ihi nka nurunu okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n’oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n’aka-nri-Ya na n’aka-ekpe-Ya.

19 Jehova we si. Ònye gārafu Ehab, bú eze Israel, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Otù onye nke nēkwu okwu we si otú a, onye ọzọ nke nēkwu okwu si kwa otú a.

20 Mọ ahu we puta, guzo n’iru Jehova, si, Mu onwem gārafu ya. Jehova we si ya, Gini ka i gēji?

21 Ọ si, M’gāpu, buru mọ okwu-ugha n’ọnu ndi-amuma-ya nile. Ọ si, I gārafu ya, i gēnwe kwa ike: pua, me otú a.

22 Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n’ọnu ndi-amuma-gi ndia; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi.

23 Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n’ebe m’nọ gabiga igwa gi okwu?

24 Maikaia we si, Le, i ganāhu n’ubọchi ahu, mb͕e i gābà n’ime-ulo nke di n’ime-ulo izo onwe-gi.

25 Eze Israel we si, Kurunu Maikaia, me ka ọ laghachikuru Emon, bú onye-isi obodo, laghachikuru kwa Joash, bú nwa eze,

26 unu gāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n’ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m’gālaghachi n’udo.

27 Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n’udo, Jehova ekwughi okwu n’ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n’uwa, unu nile.

28 Eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, we rigorue Remot-gilead.

29 Eze Israel we si Jehoshafat, M’gēnwoghari onwem, ba n’agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya; ha we ba n’agha.

30 Ma eze Siria nyere ndi-isi ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya.

31 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, Eze Israel ka ọ bu. Ha we chigharia ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu, Jehova we yere ya aka; Chineke we kpalie ha isi n’ebe ọ nọ pua.

32 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru na ọ bughi eze Israel, ha we si n’iso ya laghachi.

33 Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n’etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m’si n’ọmuma-ulo-ikwū pua; n’ihi na ọria nāriam.

34 Agha we la elu n’ubọchi ahu: eze Israel we guzogide onwe-ya n’ub͕ọ-ala-ya imegide Siria rue anyasi: ọ we nwua mb͕e anyanwu nāda.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 19

1 Jehoshafat, bú eze Juda, we laghachi n’ulo-ya n’udo, rue Jerusalem.

2 Jihu nwa Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, we pua izute ya, ọ si eze, bú Jehoshafat, Ò kwesiri gi iyere onye nēmebi iwu aka? ọ̀ bu kwa ndi nākpọ Jehova asì ka i nāhu n’anya? ma n’ihi ihe a iwe dikwasi gi site n’iru Jehova.

3 Otú ọ di, achọtawo ezi ihe n’aka-gi, n’ihi na i mewo ka Asherot si n’ala nka gabiga, i we dozie obi-gi ichọ Chineke.

4 Jehoshafat we biri na Jerusalem: o we jeghachi pua jegharia n’etiti ndi-ya site na Bia-sheba rue ugwu Efraim, me ka ha laghachikute Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

5 O we guzo ndi-ikpe n’ala-ya n’obodo nile ewusiri ike nke Juda, n’obodo n’obodo,

6 ọ si ndi-ikpe, Lenu ihe unu onwe-unu nēme: n’ihi na ọ bughi madu ka unu nēkpere ikpe, kama ọ bu Jehova; Ọ nọye-kwa-ra unu n’okwu ikpe-unu.

7 Ma ub͕u a ka oké egwu Jehova dikwasi unu; lezienu anya, me ya: n’ihi na ọ dighi ajọ omume, ma-ọbu ihu-madu-iru-ọma, ma-ọbu inara-ihe-iri-ngo, di nime Jehova, bú Chineke-ayi.

8 Ọzọ kwa, nime Jerusalem ka Jehoshafat guzoro ufọdu nime ndi Livai na ndi-nchu-àjà, na ufọdu nime ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ikpe ikpe Jehova, na idozi ise-okwu. Ha we laghachi na Jerusalem.

9 O nye ha iwu, si, Otú a ka unu gēme n’egwu Jehova, na n’ikwesi-ntukwasi-obi, na n’obi zuru okè.

10 Ma mb͕e ise-okwu ọ bula gēru unu nti site n’umu-nne-unu ndi bi n’obodo-ha, n’etiti ọbara na ọbara, n’etiti iwu na ihe enyere n’iwu, na ukpuru na ikpé, unu gēme kwa ka ha ghọta, ka ikpe we ghara ima ha n’ebe Jehova nọ, iwe ewe dikwasi unu, dikwasi kwa umu-nne-unu: otú a ka unu gēme, ikpe agaghi-ama kwa unu.

11 Ma, le, Amaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, bu onye-isi-unu n’okwu ọ bula nke Jehova; Zebadaia nwa Ishmael, bú onye-ndú ulo Juda, bu onye-isi-unu n’okwu ọ bula nke eze: ndi Livai gābu kwa ndi-odozi-okwu n’iru unu. Dinu ike, me; ka Jehova nọye-kwa-ra ezi madu.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 20

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na umu Moab, na umu Amon, ha na ufọdu site na ndi ọzọ, biara imegide Jehoshafat n’agha.

2 Madu ufọdu we bia gosi Jehoshafat, si, Ìgwè madu bara uba esiwo n’ofè oké osimiri, site na Siria, bia imegide gi; ma, le, ha nọ nime Hazazon-tema (nke bu En-gedi).

3 Jehoshafat we tua egwu, che iru-ya ichọ Jehova; o we kpọsa obubu-ọnu na Juda nile.

4 Juda we chikọta onwe-ha ichọ iye-aka site n’aka Jehova: ọbuná site n’obodo nile nke Juda ka ha biara ichọsi Jehova ike.

5 Jehoshafat we guzo nime nkpọkọta Juda na Jerusalem, n’ulo Jehova, n’iru ogige ọhu;

6 ọ si, Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Chineke n’elu-igwe? ọ̀ bughi Gi onwe-gi nāchi kwa ala-eze nile nke mba nile? ọ bu kwa n’aka-Gi ka ume na idi-ike di, ọ dighi kwa onye gēguzo onwe-ya n’ebe I nọ.

7 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke-ayi, napuru ndi bi n’ala nka ala-ha n’iru ndi-Gi, bú Israel, were ya nye nkpuru Abraham, bú onye nāhu Gi n’anya, rue mb͕e ebighi-ebi?

8 Ha we biri nime ya, wuere Gi ebe nsọ nime ya nye aha-Gi, si,

9 Ọ buru na ihe ọjọ abiakwasi ayi, bú mma-agha ikpé, ma-ọbu ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu oké unwu, ayi gēguzo n’iru ulo a, na n’iru Gi, (n’ihi na aha-Gi di n’ulo a,) si na nkpab͕u-ayi tikue Gi, I gānu kwa, zọputa.

10 Ma ub͕u a, le, umu Amon na Moab na ugwu Sia, ndi I nēkweghi Israel ka ha bakuru ha, mb͕e ha nēsi n’ala Ijipt bia, kama ha si n’ebe ha nọ wezuga onwe-ha, ha ekpochapughi kwa ha;

11 ma, le, otú ndi ahu nēnyeghachi ayi, n’ibia ichupu ayi n’ihe-nnweta-Gi, nke I meworo ka ayi nweta.

12 Chineke-ayi, Ì gaghi-ekpe ha ikpe? n’ihi na ike adighi nime ayi n’iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amaghi kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi.

13 Juda nile nēguzo kwa n’iru Jehova, ha na umu-ntakiri-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha.

14 Ma Mọ Jehova dikwasiri Jahaziel nwa Zekaraia, nwa Benaia, nwa Jeiel, nwa Matanaia, bú onye Livai, onye sitere n’umu Esaf, n’etiti nkpọkọta ahu;

15 ọ si, Ṅanu nti, Juda nile, na ndi bi na Jerualem, na eze-ayi, bú Jehoshafat, otú a ka Jehova siri unu, Unu onwe-unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ n’iru ìgwè madu a bara uba; n’ihi na ọ bughi unu nwe agha nka, kama ọ bu Chineke nwe.

16 Echi ridanu imegide ha: le, ha nārigo n’uzọ-nrigo Ziz; unu gāchọta kwa ha na nsọtu ndagwurugwu, n’iru ọzara Jeruel.

17 Ọ bughi unu gēnwe ibu agha n’agha nka: guzonu onwe-unu, guzo, hu nzọputa Jehova n’etiti unu, Juda na Jerusalem: unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ: echi pukurunu ha; Jehova nọye-kwa-ra unu.

18 Jehoshafat we rube isi kpuchie iru-ya n’ala: Juda nile na ndi bi na Jerusalem da-kwa-ra n’ala n’iru Jehova, ikpọ isi ala nye Jehova.

19 Ndi Livai, bú ndi sitere n’umu ndi Kohat na ndi sitere n’umu ndi Kora, we bilie ito Jehova, bú Chineke Israel, n’olu di uku ri nne.

20 Ha we bilie n’isi-ututu, pua ba n’ọzara Tekoa: ma mb͕e ha nāpu, Jehoshafat guzoro, si, Nurunum, Juda, na ndi bi na Jerusalem; kwerenu na Jehova, bú Chineke-unu, unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu na ndi-amuma-Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma.

21 O we me ka ndi-ya dua ya ọdu, o we guzo ndi nābùku Jehova abù, ndi nēto kwa ima-nma nke idi-nsọ, mb͕e ha nāpu n’obodo n’iru ndi ejikere agha, si, Kelenu Jehova; n’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

22 Ma na mb͕e ha malitere iti nkpu na ito otuto, Jehova tiyere ndi nēru nbì imegide umu Amon na Moab na ugwu Sia, bu ndi nābakuru Juda; ewe tib͕ue ha.

23 Umu Amon na Moab we guzo imegide ndi bi n’ugwu Sia, iwezuga ha ka ebibie ha na ikpochapu ha: mb͕e ha mere ka ndi bi na Sia gwusia, ha we yere onwe-ha aka, nwoke na ibe-ya, ibibi onwe-ha.

24 Juda we biarue ulo-nche, rue ọzara, ha we le ìgwè madu ahu anya; ma, le, ha bu ozu ozu daworo n’ala, ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu.

25 Jehoshafat na ndi-ya we bia iluta ihe-nkwata-ha n’agha, ha we hu n’etiti ha ma àkù ma ozu ma ihe di oké ọnu-ahia n’uba, ha we napusia onwe-ha ihe, kari nke ha nwere ike ibū: ha we nọ ubọchi atọ nāluta ihe-nkwata n’agha, n’ihi na ihe bara uba ka ọ bu.

26 Ma n’ubọchi nke-anọ ha kpọkọtara onwe-ha na ndagwurugwu Beraka; n’ihi na n’ebe ahu ka ha gọziri Jehova: n’ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Bekara, rue ta.

27 Ha we lata, nwoke ọ bula nke Juda na Jerusalem, Jehoshafat nāga kwa n’iru ha, iwere ọṅù lata na Jerusalem; n’ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu n’iru ndi-iro-ha.

28 Ha we chiri une, na ubọ-akwara, na opì, biarue Jerusalem rue ulo Jehova.

29 Oké egwu Chineke we dikwasi ala-eze nile nke ala nile ọzọ, mb͕e ha nuru na Jehova busoro ndi-iro Israel agha.

30 Ala-eze Jehoshafat we di jū: n’ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike buruburu.

31 Jehoshafat we buru eze Juda: ọ b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi.

32 O jere ije n’uzọ Esa nna-ya, o sighi kwa nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n’anya Jehova.

33 Nání na ewezugaghi ebe di elu; ma rue ub͕u a ndi Juda edozighi obi-ha nye Chineke nke ndi bu nna-ha.

34 Ma ihe nile Jehoshafat mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n’akwukwọ ihe emere nke Jihu nwa Hanani, onye etiyere aha-ya n’akwukwọ ndi-eze Israel.

35 Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Jehoshafat, bú eze Juda, jikọrọ onwe-ya na Ehazaia, bú eze Israel; onye ahu nēmebi iwu n’omume-ya:

36 o we jikọ onwe-ya na ya ime ub͕ọ ijeru Tashish: ha we me ub͕ọ ahu n’Ezion-geba.

37 Elieza nwa Dodavahu nke Marisha we bu amuma megide Jehoshafat, si, N’ihi na i jikọrọ onwe-gi na Ehazaia, Jehova etipúwo ihe i mere. Ewe tiwa ub͕ọ ahu nile, ha enweghi kwa ike ijeru Tashish.