Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 1

1 Solomon nwa Devid we me onwe-ya ka ọ di ike n’ala-eze ya, Jehova, bú Chineke-ya, we nọyere ya, me ka ọ di uku ri nne.

2 Solomon we gwa Israel nile okwu, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-ikpe, na onye-isi ọ bula nke Israel nile, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna.

3 Solomon, ya na nkpọkọta ahu nile, we jerue ebe di elu nke di na Gibeon; n’ihi na n’ebe ahu ka ulo-ikwū nzute nke Chineke di, bú nke Moses, bú orù Jehova, mere n’ọzara.

4 Ma Devid siri na Kiriat-jearim bugota ib͕e Chineke rue ọnọdu nke Devid doziri ya: n’ihi na ọ mara ulo-ikwū nye ya nime Jerusalem.

5 Ma ebe-ichu-àjà ọla ahu, nke Bezalel nwa Uri, nwa Hua, mere, di n’ebe ahu n’iru ebe-obibi Jehova: Solomon na nkpọkọta ahu we chọ ya.

6 Solomon we rigo n’ebe ahu rue ebe-ichu-àjà ọla n’iru Jehova, nke di n’ulo-ikwū nzute, o we sure nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri n’elu ya.

7 N’abali ahu ka Chineke mere ka Solomon hu ya anya, O we si ya, Riọ ihe M’gēnye gi.

8 Solomon we si Chineke, Gi onwe-gi emeworo Devid nnam ebere uku, I we mem eze n’ọnọdu ya.

9 Ub͕u a, Jehova, bú Chineke, ka okwu-Gi nke I gwara Devid nnam buru ihe kwesiri ntukwasi-obi: n’ihi na Gi onwe-gi emewom eze otù ndi nke bara uba dika ájá ala.

10 Ub͕u a nyem amam-ihe na ihe-ọmuma, ka m’we nāpu apu nābata kwa abata n’iru ndi nka: n’ihi na ònye gēkpe ndi-Gi nka di uku ikpe?

11 Chineke we si Solomon, N’ihi na nka di n’obi-gi, ma i riọghi àkù, ma-ọbu ihe-nkpakọta, ma-ọbu nsọpuru, ma-ọbu ndu ndi nākpọ gi asì, i riọghi kwa ọtutu ubọchi; kama i riọworo onwe-gi amam-ihe na ihe-ọmuma, ka i we kpe ndim ikpe, bú ndi M’meworo gi eze-ha:

12 enyewo gi amam-ihe na ihe-ọmuma; M’gēnye kwa gi àkù, na ihe-nkpakọta, na nsọpuru, nke ndi-eze ndi buru gi uzọ nēnweghi otú a, ọ dighi kwa onye nke gēso gi gēnwe otú a.

13 Solomon we si n’ije ọ jeruru ebe di elu nke di na Gibeon, si n’iru ulo-ikwū nzute, biarue Jerusalem; o we buru eze Israel.

14 Solomon we chikọta ub͕ọ-ala na ndi-inyinya: o we nwe nnù ub͕ọ-ala atọ na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, o we do ha n’obodo ub͕ọ-ala, na n’ebe eze nọ na Jerusalem.

15 Eze we me ọla-ọcha na ọla-edo ka ọ di ka nkume na Jerusalem, o me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n’ebe di ala ala n’uba.

16 Anēme kwa ka inyinya Solomon nwere si n’Ijipt puta; n’usu ka ndi-ahia eze nānara ha, otù usu n’ọnu-ahia-ya.

17 Ha we me ka otù ub͕ọ-ala rigota si n’Ijipt puta na nnù shekel ọla-ọcha na ọgu iri, na otù inyinya n’ọgu shekel asa na iri: otú a ka ha nēweputara eze nile nke ndi Het, na ndi-eze Siria, site n’aka-ha.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 2

1 Solomon we si na o gēwuru aha Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo.

2 Solomon we guta orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise, bú ndi-ibu, na orú nnù ndikom uzọ iri ndi nāwa ihe-ọwuwa n’ugwu, na nnù ndikom iteghete ndi edoro ndi-isi-ha.

3 Solomon we zigara Huram, bú eze Taia, ozi, si, Otú i mere Devid nnam, we zitere ya osisi cedar iwuru ya ulo ibi nime ya, me-kwa-ram otú a.

4 Le, mu onwem nēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, idoro Ya nsọ, isure n’iru Ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na idebe n’ebe ahu achicha anēdo n’usoro mb͕e nile, na isure àjà-nsure-ọku n’ututu na n’anyasi, na n’ubọchi-izu-ike nile, na n’ọnwa ọhu nile, na mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú Chineke-ayi. Rue mb͕e ebighi-ebi ka nka dikwasi Israel.

5 Ma ulo nke mu onwem nēwu di uku, n’ihi na Chineke-ayi di uku kari chi nile.

6 Ma ònye nwere ike iwuru Ya ulo, n’ihi na elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe nāgaghi-anagide Ya? ònye kwa ka mu onwem bu, na m’gēwuru Ya ulo, ma-ọbughi nání isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’iru Ya?

7 Ma ub͕u a ziterem otù nwoke mara ihe n’ilu ọlu n’ọla-edo, na n’ọla-ọcha, na n’ọla, na n’ígwè, na n’ogho ododo na ogho uhie na ogho anunu, onye ma-kwa-ra iso ndi mara ihe, ndi nọ n’ebe m’nọ na Juda na nime Jerusalem, bú ndi Devid nnam doziri, b͕u eb͕ub͕u.

8 Si kwa na Lebanon ziterem osisi cedar, na osisi fir, na osisi algum: n’ihi na mu onwem amawo na ndi-orù-gi mara ib͕utu osisi nime Lebanon; ma, le, ndi-orùm gēso kwa ndi-orù-gi,

9 ọbuná idozirim osisi n’uba: n’ihi na ulo ahu nke mu onwem nēwu gādi uku di kwa ebube.

10 Ma, le, m’gēnye ndi-orù-gi, bú ndi nāwa ihe-ọwuwa ndi nēb͕utu osisi, orú nnù ọtùtù cor uzọ abua na nnù iri nke ọka wheat asuru asu, na orú nnù ọtùtù cor uzọ abua na nnù iri nke ọka barley, na orú nnù ọtùtù bath uzọ abua na nnù iri nke manya-vine, na orú nnù ọtùtù bath uzọ abua na nnù iri nke manu.

11 Huram, bú eze Taia, we were odide-akwukwọ, nke o zitere Solomon, si, N’ihi na Jehova huru ndi-Ya n’anya, n’ihi ya ka O mere gi eze-ha.

12 Huram we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye mere elu-igwe na uwa, Onye nyeworo Devid, bú eze, nwa-nwoke nke mara ihe, onye mara ezi uche na nghọta, onye gēwuru Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo.

13 Ma ub͕u a ezitewom otù nwoke nke mara ihe, onye mara nghọta, nke Huram, bú nnam,

14 bú nwa nke nwayi nke sitere n’umu-ndinyom Dan, ma nna-ya bu nwoke Taia, ọ bu onye mara ilu ọlu n’ọla-edo, na n’ọla-ọcha, na n’ọla, na n’ígwè, na nkume, na n’osisi, na n’ogho ododo, na n’ogho anunu, na n’ezi ákwà ọcha, na n’ogho uhie; na ib͕u eb͕ub͕u ọ bula, na ichèputa ihe-nchèputa ọ bula: ka ewe nye ya ọnọdu n’etiti ndi-gi mara ihe, na ndi mara ihe nke onye-nwem, bú Devid nna-gi.

15 Ma ub͕u a ọka wheat ahu na ọka barley ahu na manu ahu na manya-vine ahu, bú nke onye-nwem kwuru, ya zitere ndi-orù-ya:

16 Ayi onwe-ayi gēb͕utu kwa osisi site na Lebanon, dika nkpà-gi nile si di: ayi gāb͕a kwa ha me ka ha se n’elu oké osimiri rue gi aru, rue Jafo; gi onwe-gi gēbugota kwa ha na Jerusalem.

17 Solomon we gua ndikom nile, bú ndi-ọbìa, ndi nọ n’ala Israel, mb͕e ọgugu ahu gasiri, bú nke Devid nna-ya guru ha; ewe hu na ha di orú nnù ndikom uzọ iri-na-iteghete na nnù anọ.

18 O we me orú nnù uzọ asatọ na nnù iri-na-ise nime ha ka ha buru ndi-ibu, na orú nnù uzọ iri ka ha buru ndi nāwa ihe-ọwuwa n’ugwu, na nnù iteghete ka ha buru ndi edoro ndi-isi ime ka ndi ahu fè òfùfè.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 3

1 Solomon we malite iwu ulo Jehova nime Jerusalem n’ugwu Moraia, ebe Jehova mere ka Devid, bú nna-ya, hu Ya anya, nke o doziri n’ebe Devid rọputara, n’ebe-nzọcha-ọka Ọnan, bú onye Jebus.

2 O we malite iwu ulo ahu n’ubọchi nke-abua n’ọnwa nke-abua, n’arọ nke-anọ ọ bu eze.

3 Ma n’ihe ndia ka adọrọ Solomon aka na nti iwu ulo Chineke. Ogologo-ya na cubit n’ọtùtù mbu di ọgu cubit atọ, obosara-ya di kwa orú cubit.

4 Uzọ-nbata kwa nke di n’iru ulo ahu, ogologo-ya di orú cubit, n’iru obosara ulo ahu, idi-elu-ya di kwa ọgu cubit isi: o we were ọla-edo anāgwaghi agwa machita ya nime.

5 O were kwa osisi fir kpuchie ulo ahu nke di kari uku, o we were ezi ọla-edo kpuchie ya, tua akika nkwu na iyab͕a n’elu ya.

6 O were kwa nkume di oké ọnu-ahia n’ima-nma machita ulo ahu: ọla-edo-ya bu kwa ọla-edo Pavaim.

7 O were kwa ọla-edo kpuchie ulo ahu, bú ntuhie-ya nile, na nbata-uzọ-ya nile, na mb͕idi-ya nile, na ibo-ọnu-uzọ-ya nile; o b͕u-kwa-ra eb͕ub͕u cherubim na mb͕idi-ya nile.

8 O me-kwa-ra ulo nsọ kachasi ulo nsọ nile; ogologo-ya di orú cubit, n’iru obosara ulo ahu, obosara-ya di kwa orú cubit: o were ezi ọla-edo, ra ka nnù talent na ọgu iri, kpuchie ya.

9 Ọtùtù ǹtú-ya nile di ọgu shekel ọla-edo abua na iri. O were kwa ọla-edo kpuchie ime-ulo-elu nile.

10 O me kwa cherubim abua, bú ihe emere dika ihe apiri api, n’ulo nsọ ahu kachasi ulo nsọ nile; ha machita ha ọla-edo.

11 Ma nkù cherubim ahu, ogologo-ha di orú cubit: nkù otù cherub di cubit ise, nēmetu mb͕idi ulo ahu; nkù-ya nke-ọzọ di kwa cubit ise, nēmetu nkù cherub nke-ọzọ.

12 Nkù cherub nke-ọzọ di kwa cubit ise, nēmetu mb͕idi ulo: nkù-ya nke-ọzọ di cubit ise, nārapara na nkù cherub nke-ọzọ.

13 Nkù cherubim ndia nāb͕asa orú cubit: ha onwe-ha nēguzo kwa n’ukwu-ha, iru-ha che-kwa-ra n’ulo.

14 O me-kwa-ra ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, o we tua akika cherubim n’elu ya.

15 O me kwa n’iru ulo ogidi abua, orú cubit na iri na ise ka ogologo-ha di, isi nke di n’elu-ha n’otù n’otù di kwa cubit ise.

16 O me kwa iyab͕a n’ime-ime-ulo ahu, tiye ha n’elu ogidi ahu; o me-kwa-ra ọgu pomegranate ise, tiye ha n’elu iyab͕a.

17 O guzo ogidi abua ahu n’iru ulo uku Chineke, otù n’aka-nri, otù n’aka-ekpe; o we kpọ aha ogidi aka-nri Jakin, na aha ogidi aka-ekpe Boaz.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 4

1 O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ọla, orú cubit ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di kwa, cubit iri ka idi-elu-ya di kwa.

2 O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n’otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di buruburu buruburu, cubit ise ka idi-elu-ya di; eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu.

3 Oyiyi ehi di kwa n’okpuru ya, ndi nọ ya buruburu buruburu, ha di cubit iri, nāb͕a oké osimiri ahu buruburu. Ehi ahu di iri na abua, awuru mb͕e awuru ya.

4 O nēguzo n’elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n’Ugwu, atọ nēche iru n’Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n’Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n’elu, azu-ha nile di kwa nime.

5 Ib͕idi-ya di otù ntù-ọbu-aka; emere ọnu-ya dika anēme ọnu iko, dika okoko urodi: ọ nānara nagide kwa nnù bath asa na ọgu iri.

6 O me-kwa-ra ite ọsisa-miri iri, tiye ise n’aka-nri, na ise n’aka-ekpe, iji sa anu; ihe diri àjà-nsure-ọku ka ha nāṅacha nime ha: ma oké osimiri ahu diri ndi-nchu-àjà iji sa aru.

7 O me kwa ihe-idọba-oriọna iri nke ọla-edo dika ikpé-ha si di; o tiye ha n’ulo uku Chineke, ise n’aka-nri, na ise n’aka-ekpe.

8 O me kwa table iri, dọba ha n’ulo uku Chineke, ise n’aka-nri, na ise n’aka-ekpe. O me kwa ọgu ọkwa-nwusa ise nke ọla-edo.

9 O me kwa ogige ndi-nchu-àjà, na ogige uku ahu, na ibo-ọnu-uzọ itiye n’ogige ahu, were ọla machita ibo-ọnu-uzọ-ha.

10 O tiye oké osimiri ahu n’akuku aka-nri ulo ahu n’akuku Iru-anyanwu na ncherita-iru Ndida.

11 Huram me-kwa-ra ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Huram we jebìe ozi nke o jere eze, bú Solomon, n’ulo Chineke:

12 ogidi abua ahu, na ọkwa abua ahu, na isi abua ahu nke di n’elu ogidi abua; na ihe-ọkpukpa abua ahu ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n’elu ogidi;

13 na nnù pomegranate ahu nke diri ihe-ọkpukpa abua ahu; bú ariri pomegranate abua bayere otù ihe-ọkpukpa, ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n’iru ogidi.

14 O me-kwa-ra ihe-ndọkwasi iri ahu, me kwa ite ọsisa-miri iri ahu nke di n’elu ihe-ndọkwasi;

15 na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n’okpuru ya.

16 Na ite nile, na osekè nile, na ndudu nile, na ihe-ha nile, ndia ka Huram nna-ya mere eze, bú Solomon, bayere ulo Jehova, ha bu ọla echichara echicha.

17 Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n’ala urọ n’etiti Sukot na Zerida.

18 Solomon we me ihe ndia nile n’uba nke-uku: n’ihi na achọputaghi ọtùtù ọla ahu.

19 Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n’ulo Chineke, ebe-ichu-àjà ọla-edo kwa, na table nke achicha iru Chineke di n’elu ha;

20 na ihe-idọba-oriọna na oriọna nile ha, inwu enwu dika ikpé si di n’iru ime-ime-ulo ahu, ha bu ọla-edo makarisiri nma;

21 na okoko-osisi nile, na oriọna nile, na nkpa nile, ha bu ọla-edo, nke ahu bu ọla-edo dizu nma;

22 na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma: ọnu-uzọ ulo ahu kwa, ibo-ọnu-uzọ ime-ime ya nile nke diri ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo ahu, bú ulo uku Chineke, bu ọla-edo.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 5

1 Ewe jezue ozi nile nke Solomon jere ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ; bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o tiye ha n’ulo-àkù nke ulo Chineke.

2 Mb͕e ahu Solomon kpọkọtara ndi-okenye Israel, na ndi-isi nile nke ebo nile ha, bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Israel, ibiaru Jerusalem, isi n’obodo Devid, nke ahu bu Zaion, bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.

3 Ndikom nile nke Israel we kpọkọta onwe-ha biakute eze n’ememe, nke ahu bu ọnwa nke-asa.

4 Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi Livai we bulie ib͕e ahu.

5 Ha we bugota ib͕e ahu, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n’Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bugotara ha.

6 Eze, bú Solomon, na nzukọ nile nke Israel, bú ndi nēzukọta n’ebe ọ nọ, nọ n’iru ib͕e ahu, nāchu n’àjà ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, nke anādighi-agu ha ọnu, nke anādighi-aguta kwa ha n’ihi iba-uba-ha.

7 Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n’ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n’okpuru nkù cherubim.

8 N’ihi na cherubim nāb͕asa nkù-ha n’elu ebe ib͕e ahu, cherubim ahu we nēkpuchi ib͕e ahu na nkpa-n’aka-ya abua n’elu.

9 Nkpa-n’aka di ogologo, ewe hu isi nkpa-n’aka site n’ib͕e ahu n’iru ime-ime-ulo ahu; ma adighi-ahu ha n’èzí: o we di n’ebe ahu, rue ta.

10 Ọ dighi ihe di n’ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses tiyere nime ha na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n’Ijipt puta.

11 O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà siri n’ebe nsọ puta, (n’ihi na ndi-nchu-àjà nile ahuru doro onwe-ha nsọ, ọ dighi onye ọ bula idebe ihe n’òkè n’òkè;

12 ọzọ, ndi Livai, bú ndi-ọbù-abù, ọbuná ha nile, bú Esaf na Himan, na Jedutun, na umu-ha ndikom, na umu-nne-ha, nēguzo kwa n’akuku ọwuwa-anyanwu nke ebe-ichu-àjà ahu, yiri ezi ákwà ọcha, chiri kwa ájà na une na ubọ-akwara, ọgu ndi-nchu-àjà isi ndi nāfù opi so-kwa-ra ha:)

13 o we rue, mb͕e ndi nāfù opì na ndi-ọbù-abù di ka otù onye, ime ka anu otù olu n’ito na n’ikele Jehova, mb͕e ha were kwa opì na ájà, na ihe abù, na otuto eji to Jehova, welie olu-ha elu, si, N’ihi na Ọ di nma: n’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na igwe-oji juputara ulo ahu, bú ulo Jehova,

14 ndi-nchu-àjà we ghara inwe ike iguzo ije ozi n’ihi igwe-oji ahu: n’ihi na ebube Jehova juputara ulo Chineke.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 6

1 Mb͕e ahu Solomon siri, Jehova asiwo na O gēbi n’oké ọchichiri.

2 Ma mu onwem ewuworo Gi ulo obibi, bú ọnọdu guzosiri ike ebe I gēbi rue mb͕e ebighi-ebi.

3 Eze we chigharia iru-ya, gọzie nkpọkọta nile nke Israel: nkpọkọta nile nke Israel nēguzo kwa.

4 Ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye were ọnu-Ya gwa Devid, bú nnam, okwu, were kwa aka-Ya abua mezue ya, si,

5 Site n’ubọchi mb͕e M’mere ka ndim si n’ala Ijipt puta, arọputaghm obodo n’ebo nile nke Israel iwu ulo, ka aham we di n’ebe ahu; arọputaghkwam nwoke ọ bula ibu onye-ndú ndim, bú Israel:

6 ma arọputaram Jerusalem, ka aham we di n’ebe ahu; arọputa-kwa-ram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel.

7 O we di n’obi Devid, bú nnam, iwuru aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo.

8 Jehova we si Devid, bú nnam, N’ihi na ọ di n’obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n’obi-gi:

9 otú ọ di gi onwe-gi agaghi-ewu ulo ahu; kama, nwa-gi nwoke nke nēsi n’úkwù-gi puta, onye ahu gēwuru aham ulo.

10 Jehova emewo kwa ka okwu-Ya nke O kwuru guzosie ike; m’we bilie n’ọnọdu Devid, bú nnam, nọkwasi n’oche-eze Israel, dika Jehova kwuru, m’we wuere aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo,

11 dọba ib͕e ahu n’ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n’ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na umu Israel b͕ara.

12 O we guzo n’iru ebe-ichu-àjà Jehova n’iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua:

13 (n’ihi na Solomon mere ebe-nguzo di elu nke ọla-cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu, ya di kwa, o we tiye ya n’etiti ogige; o we guzo n’elu ya, b͕u ikperè-ya n’ala n’iru nkpọkọta nile nke Israel, b͕asa ọbu-aka-ya abua n’ebe elu-igwe di:)

14 ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n’elu-igwe, ma-ọbu n’uwa; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n’iru Gi:

15 I debeworo orù-Gi Devid, bú nnam, ihe I gwara ya: I we were ọnu-Gi kwue, were kwa aka-Gi mezue ya, otú ọ di ta.

16 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, debere orù-Gi Devid, bú nnam, okwu nke I gwaworo ya, si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n’irum n’inọkwasi n’oche-eze Israel; nání ọ buru na umu-gi elezi uzọ-ha anya, ijeghari n’iwum dika i jeghariworo n’irum.

17 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid.

18 Ma ọ̀ bu ezie na Chineke gēbiyere madu n’elu uwa? le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agaghi-anagide Gi; ulo a nke m’wuworo, ò gēsi kwa aṅa rue inagide Gi?

19 Ma che iru n’ekpere orù-Gi, na n’aririọ-amara-ya, Jehova, bú Chinekem, ige nti iti-nkpu na ekpere orù-Gi nēkpe n’iru Gi:

20 ka anya-Gi abua we nāsaghe n’ebe ulo a di ehihie na abali, bú n’ebe ebe ahu di nke I siworo na I gētiye aha-Gi n’ebe ahu; ige nti ekpere nke orù-Gi gēkpe n’ebe ebe a di.

21 Ge kwa nti aririọ-amara nile nke orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, mb͕e ha nēkpe ekpere n’ebe ebe a di: Gi onwe-gi si kwa n’ebe obibi-Gi, bú site n’elu-igwe, nuru; mb͕e I nuworo, Gi b͕aghara kwa.

22 Ọ buru na nwoke emehie megide madu-ibe-ya, ewe tukwasi ya iyi ime ka ọ ṅua, iyi ahu we bia n’iru ebe-ichu-àjà-Gi n’ulo a:

23 Gi onwe-gi si kwa n’elu-igwe nuru, me kwa, kpe ndi-orù-gi ikpe, inyeghachi onye ikpe mara, itukwasi uzọ-ya n’isi-ya; na igu onye ezi omume n’onye ezi omume, inye ya dika ezi omume-ya si di.

24 Ọ buru kwa na etib͕ue ndi-Gi, bú Israel, n’iru onye-iro, n’ihi na ha nēmehie megide gi; ọ buru kwa na ha alaghachi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ amara n’iru Gi n’ulo a:

25 Gi onwe-gi si kwa n’elu-igwe nuru, b͕aghara nmehie ndi-Gi, bú Israel, me ka ha lata n’ala nke I nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha.

26 Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n’ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n’ebe ebe a di, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n’ihi na I nēweda ha n’ala:

27 Gi onwe-gi nuru kwa n’elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, n’ihi na I nēzí ha ezi uzọ nke ha ganēje ije nime ya; Gi me kwa ka miri zokwasi ala-Gi, nke I nyeworo ndi-Gi ibu ihe-nketa.

28 Mb͕e oké unwu gādi n’ala, mb͕e ajọ ọria nke nēfe efe gādi, mb͕e nchakpọ gādi, ma-ọbu ọmuma-ebu, ma-ọbu igurube, ma-ọbu ọbubu; mb͕e ndi-iro-ha gānọchigide ha n’agha n’ala nke ọnu-uzọ-ama nile ha; ihe-otiti ọ bula, ma-ọbu ọria ọ bula;

29 ekpere ọ bula, aririọ-amara ọ bula, nke gādiri madu ọ bula, ma-ọbu nke gādiri ndi-Gi nile, bú Israel, ndi gāmara, nwoke ọ bula ihe-otiti-ya na ihe-nb͕u-ya, o we b͕asa ọbu-aka-ya abua n’ebe ulo a di:

30 Gi onwe-gi si kwa n’elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, b͕aghara, nye nwoke ọ bula dika uzọ-ya nile si di, onye I mara obi-ya; (n’ihi na Gi onwe-gi amawo obi umu madu, nání Gi;)

31 ka ha we tua egwu Gi, ije ije n’uzọ-Gi nile, ubọchi nile nke ha onwe-ha nēbi n’elu ala ahu nke I nyere nna-ayi-hà.

32 Ọzọ kwa, ihe bayere onye ala ọzọ, nke ọ bughi na ndi-Gi, bú Israel, ka o sitere, ma o siwo n’ala di anya bia n’ihi aha uku Gi, na aka-Gi di ike, na ogwe-aka-Gi esetiri eseti; mb͕e ha gābia kpe ekpere n’ebe ulo a di:

33 Gi onwe-gi si kwa n’elu-igwe, site n’ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n’ulo a nke M’wuworo.

34 Mb͕e ndi-Gi gāpu ibuso ndi-iro-ha agha, n’uzọ ọ bula I gēziga ha, ha we kpere Gi n’uzọ obodo ahu nke I rọputaworo, na n’ebe ulo a di nke m’wuworo aha-Gi:

35 Gi si kwa n’elu-igwe nuru ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha.

36 Mb͕e ha gēmehie megide Gi, (n’ihi na ọ dighi madu ọ bula nke nādighi-emehie,) I we wesa ha iwe, rara ha nye n’iru onye-iro-ha, ndi nādọta ha n’agha ewe dọta ha n’agha je n’ala di anya ma-ọbu nke di nso;

37 ha we chègharia n’obi-ha n’ala ebe adọtara ha n’agha, we chigharia, riọ Gi amara n’ala ndọta-n’agha-ha, si, Ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu-Gi;

38 ọ buru kwa na ha ewere obi-ha nile, were kwa nkpuru-obi-ha nile, laghachikute Gi n’ala ndọta-n’agha-ha, bú ebe ha dọtara ha n’agha, we kpe ekpere n’uzọ ala-ha, nke I nyere ndi bu nna-ha, na obodo ahu nke I rọputaworo, na n’ebe ulo nke m’wuworo aha-Gi di:

39 Gi si kwa n’elu-igwe, bú site n’ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru ekpere-ha na aririọ-amara nile ha, mezie ikpé-ha; b͕aghara ndi-Gi ndi mehieworo megide Gi.

40 Ub͕u a, Chinekem, biko, ka anya-Gi abua nāsaghe, ka nti-Gi abua nāṅa kwa nti, n’ekpere nke ebe a.

41 Ma ub͕u a, bilie, Jehova, bú Chineke, ba n’ebe-izu-ike-Gi, Gi onwe-gi na ib͕e nke ike-Gi: Jehova, bú Chineke, ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri nzọputa dika uwe, ka ndi-ebere-Gi ṅuri kwa ọṅu n’idi-nma.

42 Jehova, bú Chineke, echigharila iru onye-Gi etere manu; cheta ebere nile nke Devid, bú orù-Gi.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 7

1 Ma mb͕e Solomon kpebìri ekpere, ọku siri n’elu-igwe ridata, we ripia àjà-nsure-ọku na àjà nile; ebube Jehova we juputa ulo ahu.

2 Ndi-nchu-àjà apughi kwa ibà n’ulo Jehova, n’ihi na ebube Jehova juputara ulo Jehova.

3 Umu Israel nile nēlekwasi kwa nrida ọku ahu anya, ya na ebube Jehova nke di n’elu ulo ahu; ha we ruru ala, kpuchie iru-ha n’ala n’elu pavement, kpọ isi ala, we kele Jehova, si, N’ihi na Ọ di nma; n’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

4 Eze na ndi Israel nile nāchu kwa àjà n’iru Jehova.

5 Eze, bú Solomon, we chua àjà, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na ndi Israel nile we ra ulo Chineke nye Chineke.

6 Ndi-nchu-àjà nēguzo kwa, dika ihe-ndebe-ha si di; ha na ndi Livai, ndi chiri ihe abù Jehova, nke Devid, bú eze, mere ikele Jehova, n’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di, mb͕e Devid nēto Chineke site n’aka-ha: ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì n’iru ha; Israel nile nēguzo kwa.

7 Solomon we do etiti ogige nke di n’iru ulo Jehova nsọ; n’ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na abuba àjà-udo n’ebe ahu: n’ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke Solomon mere apughi inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba ahu.

8 Solomon we me ememe na mb͕e ahu ubọchi asa, ya na Israel nile, oké nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt.

9 Ha we me ememe nb͕ochi n’ubọchi nke-asatọ: n’ihi na ha mere ememe ira ebe-ichu-àjà nye Chineke ubọchi asa, me kwa ememe ahu ubọchi asa.

10 N’ubọchi nke-orú-na-atọ nke ọnwa nke-asa o we zilaga ndi Israel n’ulo-ikwū-ha, ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n’ihi ezi ihe nke Jehova mere Devid, me-kwa-ra Solomon, me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.

11 Solomon we wubìe ulo Jehova, na ulo eze: ma ihe nile nke batara n’obi Solomon ime n’ulo Jehova na n’ulo-ya, o mere ka ha ga nke-ọma.

12 Jehova we me ka Solomon hu Ya anya n’abali, Ọ si ya, Anuwom ekpere-gi, rọputa-kwa-ra Onwem ebe a ibu ulo ichu àjà.

13 Asi na eb͕ochim elu-igwe, miri-ozuzo we ghara idi, ma-ọbu asi na enyem igurube iwu iripia ala, ma-ọbu asi na ezitem ajọ ọria nēfe efe n’etiti ndim;

14 ọ buru na ndim, bú ndi akpọkwasiri ha aham, eweda onwe-ha n’ala, kpe ekpere, chọ irum, si n’uzọ ọjọ ha nile laghachi; Mu onwem gēsi kwa n’elu-igwe nuru, b͕aghara ha nmehie-ha, me ka ala-ha diri ndu.

15 Ub͕u a anyam abua ganāsaghe, ntim abua ganāṅa kwa nti, n’ekpere nke ebe a.

16 Ma ub͕u a arọputawom ulo a, do kwa ya nsọ, ka aham we di n’ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi: anyam abua na obim gādi kwa n’ebe ahu ubọchi nile.

17 Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n’irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, ọbuná ime dika ihe nile si di nke M’nyeworo gi n’iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile;

18 M’gēme kwa ka oche-eze ala-eze-gi guzosie ike, dika Mu na Devid, bú nna-gi, b͕ara ndu, M’we si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n’ichi Israel.

19 Ma ọ buru na unu onwe-unu alaghachi azu, we rapu ukpurum nile na ihe nile M’nyere n’iwu, nke M’tiyeworo n’iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha:

20 M’gēropu kwa ha n’elu alam nke M’nyeworo ha; M’gēsi kwa n’irum tupu ulo a, nke M’doworo nsọ nye aham, M’gēme kwa ya ilu na ihe-àkùkù n’etiti ndi ọzọ nile.

21 Ulo a kwa, nke kachasi elu, o gēju onye ọ bula nke nāgabiga ya anya, ọ gāsi kwa, N’ìhi gini ka Jehova meworo ala nka na ulo a otú a?

22 Ha gāsi kwa, Ọ bu n’ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Onye mere ka ha si n’ala Ijipt puta, ha we jide chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha, fè ha òfùfè: n’ihi ya ka O meworo ka ihe ọjọ a nile biakwasi ha.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 8

1 O rue, n’ọgwugwu orú arọ, nke Solomon wuru ulo Jehova na ulo-ya nime ha,

2 na obodo nile nke Huram nyere Solomon, Solomon we wue ha, me ka umu Israel biri n’ebe ahu.

3 Solomon we jerue Hemat-zoba, were ya.

4 O we wue Tadmoa n’ọzara, na obodo nile nke nchikọbata-ihe, nke o wuru na Hemat.

5 O wu-kwa-ra Bet-horon di n’elu, na Bet-horon di n’okpuru, bú obodo ewusiri ike, nke nwere mb͕idi, na ibo-ọnu-uzọ-ama siri ike, na nkpọrọ;

6 na Bealat, na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe nile di Solomon ezi nma n’obi, bú nke di ya ezi nma n’obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n’ala nile ọ nāchi.

7 Ma ndi nile fọduru n’etiti ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n’Israel;

8 site n’umu-ha ndi fọduru inọchi ha n’ala, ndi umu Israel nēmeghi ka ha gwusia, Solomon we si nime ha weputa usu ndi nēfè òfùfè, rue ta.

9 Ma Solomon emeghi ndi-orù site n’umu Israel ije ozi-ya; kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-isi ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya.

10 Ndia bu kwa ndi-isi nke ndi ahu edoro ndi-isi, ndi Solomon nwere, ọgu madu iri-na-abua na iri, ndi nwere ike n’aru ndi ahu.

11 Solomon we me ka nwa-nwayi Fero si n’obodo Devid rigorue ulo ahu nke o wuru nye ya: n’ihi na ọ siri, Nwunye m’nwere agaghi-ebi n’ulo Devid, bú eze Israel, n’ihi na ebe nile di nsọ, bú nke ib͕e Jehova bataworo nime ha.

12 Mb͕e ahu Solomon surere àjà-nsure-ọku nye Jehova n’elu ebe-ichu-àjà Jehova, nke O wuru n’iru uzọ-nbata,

13 ọbuná dika ihe ubọchi si di n’ubọchi-ya, n’isure àjà-nsure-ọku dika ihe Moses nyere n’iwu si di, n’ubọchi-izu-ike nile, na n’ọnwa ọhu nile, na na mb͕e nile akara àkà, ub͕ò atọ n’arọ, bú n’ememe achicha ekoghi-eko, na n’ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n’ememe ulo-ntu.

14 Dika ikpé Devid, bú nna-ya, si di, o we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà bayere òfùfè-ha, na ndi Livai bayere ihe-ndebe nile ha, ito Chineke, na ije ozi n’iru ndi-nchu-àjà, ime ihe ubọchi n’ubọchi-ya: o guzo-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama n’òkè nile ha n’ọnu-uzọ-ama ọ bula: n’ihi na otú a ka ihe si di nke Devid, bú onye nke Chineke, nyere n’iwu.

15 Ma ha ewezugaghi onwe-ha n’ihe eze nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai n’iwu bayere ihe ọ bula, baye-kwa-ra àkù nile.

16 Ewe dozie ije-ozi nile nke Solomon rue ubọchi atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, ru kwa mb͕e ewubìri ya. Ewuzuru ulo Jehova.

17 Mb͕e ahu Solomon jeruru Ezion-geba, ru kwa Ilot, n’usọ oké osimiri, n’ala Edom.

18 Huram we zitere ya ub͕ọ na ndi-orù ndi mara oké osimiri n’aka ndi-orù-ya; ha na ndi-orù Solomon we biarue Ofia, si n’ebe ahu weta nnù talent ọla-edo na ọgu abua na iri, wetara eze, bú Solomon.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 9

1 Ma eze-nwayi Sheba nuru akukọ Solomon, we bia iwere ilu di iche iche nwa Solomon nime Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, na camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo n’uba, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, kpayere ya uka nile nke di ya n’obi.

2 Solomon we gosi ya okwu-ya nile: ọ dighi kwa okwu ọ bula ezonariri Solomon nke ọ nēgosighi ya.

3 Eze-nwayi Sheba we hu amam-ihe Solomon, na ulo nke o wuru,

4 na ihe-oriri nke table-ya, na nnọdu nke ndi-orù-ya, na nguzo nke ndi nējere ya ozi, na uwe-ha; na ndi-obu-ihe-ọṅuṅu-ya, na uwe-ha; na nrigo-ya nke ọ nārigo n’ulo Jehova; mọ adighi kwa nime ya ọzọ.

5 O we si eze, Ezi-okwu ka ọ bu, bú okwu nke m’nuru n’alam bayere okwu-gi nile, baye-kwa-ra amam-ihe-gi.

6 Ma ekweghm okwu nile ha, rue mb͕e m’biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera uba amam-ihe-gi: i tukwasiwo ihe n’akukọ nke m’nuru.

7 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n’iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi.

8 Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n’oche-eze-Ya, iburu Jehova, bú Chineke-gi, eze: n’ihi na Chineke-gi huru Israel n’anya, ime ka ha guzo rue mb͕e ebighi-ebi, n’ihi ya ka O mere gi eze-ha, ime ihe ekpere n’ikpe na ezi omume.

9 O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche n’uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda di ka uda ahu nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon.

10 Ọzọ kwa, ndi-orù Huram, na ndi-orù Solomon, ndi siri n’Ofia bubata ọla-edo, bubatara osisi algum na nkume di oké ọnu-ahia.

11 Eze we were osisi algum ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ebe-njeghari di elu, o were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: akāhughi osisi dika osisi ahu n’ala Juda.

12 Eze, bú Solomon, nye-kwa-ra eze-nwayi Sheba ihe nile nātọ ya utọ, ihe ọ bula ọ riọrọ, nāgughi ihe o butere eze. O we chigharia, la n’ala-ya, ya onwe-ya na ndi-orù-ya.

13 Ma ọtùtù ọla-edo nke biakutere Solomon n’otù arọ di nnù talent ọla-edo na ọgu iri-na-atọ na isi;

14 nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia na ndi-ahia wetara: eze nile nke Arebia na ndi nāchi ala nēweta-kwa-ra Solomon ọla-edo na ọla-ọcha.

15 Eze, bú Solomon, we me ọgu ọta uku iri, ha bu ọla-edo etisara etisa: nnù Shekel ọla-edo etisara etisa na ọgu iri bàra n’otù ọta uku.

16 O me-kwa-ra ọgu ọta iri-na-ise, ha bu ọla-edo etisara etisa; ọgu shekel ọla-edo iri-na-ise bàra n’otù ọta: eze we tiye ha n’ulo oké ọhia Lebanon.

17 Eze me-kwa-ra oké oche-eze nnọdu ọdu, machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa.

18 Oche-eze ahu nwere ihe-nrigo isi, na ihe-nb͕akwasi-ukwu eji ọla-edo me, ejikọrọ ha na oche-eze ahu, aka di kwa n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ n’elu ebe ọnọdu-ya, ọdum abua nēguzo kwa n’akuku aka ahu.

19 Ọdum iri na abua we nēguzo n’ebe ahu n’elu ihe-nrigo isi ahu n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ: emeghi ya otú a nye ala-eze ọ bula.

20 Ihe nile eze, bú Solomon, nwere, bú nke eji aṅu ihe, bu ọla-edo, ihe nile nke ulo oké ọhia Lebanon bu kwa ọla-edo makarisiri nma: agughi ọla-ọcha n’ihe ọ bula n’ubọchi Solomon.

21 N’ihi na eze nwere ub͕ọ-nke nējeru Tashish nēso ndi-orù Huram: otù ub͕ò n’arọ atọ ka ub͕ọ Tashish nābia, nēbute ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọdu, na enwe, na ekwuru-ulo.

22 Eze, bú Solomon, we di uku kari eze nile nke uwa n’àkù na amam-ihe.

23 Eze nile nke uwa we nāchọ iru Solomon, inu amam-ihe-ya, nke Chineke tiyere n’obi-ya.

24 Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n’arọ n’arọ-ya.

25 Solomon nwe-kwa-ra nnù ulo iri nke inyinya na ub͕ọ-ala, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, o we do ha n’obodo ub͕ọ-ala nile, na n’ebe eze nọ na Jerusalem.

26 O we nāchi eze nile site n’Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt.

27 Eze we me ọla-ọcha ka ọ di ka nkume nime Jerusalem, o me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n’ebe di ala ala n’uba.

28 Anēme kwa ka inyinya si n’Ijipt, si kwa n’ala nile, putara Solomon.

29 Ma ihe nile Solomon mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ndia n’akwukwọ ihe emere nke Netan, bú onye-amuma, na n’obubu-amuma nke Ahaija, bú onye Shailo, na n’ọhù nile nke Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere Jeroboam nwa Nebat?

30 Solomon we buru eze Israel nile nime Jerusalem ọgu arọ abua.

31 Solomon we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’obodo Devid, bú nna-ya: Rehoboam nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 10

1 Rehoboam we jerue Shekem: n’ihi na Shekem ka Israel nile biaruru ime ya eze.

2 O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nọ n’Ijipt, ebe o siri n’iru Solomon, bú eze, b͕alaga,) na Jeroboam siri n’Ijipt lata.

3 Ha we ziga, kpọ ya; Jeroboam na Israel nile we bia, gwa Rehoboam okwu, si,

4 Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè.

5 Ọ si ha, Mb͕e ubọchi atọ gasiri unu laghachikutekwam. Ndi Israel we la.

6 Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n’iru Solomon nna-ya mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu?

7 Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka onye ọma, ihe-ha we tọ gi utọ, i we gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile.

8 Ma ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, o me ka umu-okorọbia dua ya ọdu, bú ndi ya na ha tokọzuru okè, ndi nēguzo n’iru ya.

9 Ọ si ha, Gini ka unu onwe-unu nādu ọdu, ka ayi we weghachiri ndi nka okwu, bú ndi gwaworom okwu, si, Me ka ọ di nfe kari, bú yoke nke nna-gi tukwasiri ayi?

10 Umu-okorọbia ndi ya na ha tokọzuru okè we gwa ya okwu, si, Otú a ka i gāsi ndi nka, ndi gwara gi okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka ọ di arọ́, ma gi onwe-gi me ka ọ di ayi nfe kari; otú a ka i gāsi ha, Nkpisi-aka nke-ntà nkem di okpotokpo kari úkwù nnam.

11 Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

12 Jeroboam na ndi Israel nile we biakute Rehoboam n’ubọchi nke-atọ, dika eze kwuru, si, Laghachikutenum n’ubọchi nke-atọ.

13 Eze we za ha okwu ike; eze, bú Rehoboam, we rapu idu-ọdu nke ndi-okenye,

14 gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na ya: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

15 Eze we ghara ige ndi Israel nti; n’ihi na nchighari nka sitere n’aka Chineke, ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Ọ gwara Jeroboam nwa Nebat site n’aka Ahaija onye Shailo.

16 Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jesi: lanu, nwoke ọ bula, n’ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel nile we la n’ulo-ikwū-ha.

17 Ma umu Israel ndi bi n’obodo nile nke Juda, Rehoboam we buru eze-ha.

18 Eze, bú Rehoboam, we ziga Hadoram, onye bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè; umu Israel we were nkume tub͕ue ya, o we nwua. Eze, bú Rehoboam, we b͕a onwe-ya ume irigo n’ubọ-ala-ya, ib͕alaga na Jerusalem.

19 Israel we jehie megide ulo Devid, rue ta.