Categories
I. TIMỌTI

I. TIMỌTI 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus dika ihe ahu si di, nke Chineke, bú Onye-nzọputa-ayi, na Kraist Jisus, bú Onye ayi nēle anya Ya, nyere n’iwu;

2 anamedegara Timọti akwukwọ, bú ezi nwam n’okwukwe: Amara na ebere na udo diri gi nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.

3 Dika m’riọrọ gi ka i nọgide n’Efesọs, mb͕e m’gaje iga nime Masedọnia, ka i we nye madu ufọdu iwu ka ha ghara izí ihe di iche,

4 ka ha ghara kwa iṅa nti akukọ-ifò di iche iche na akukọ osuso-ọmumu di iche iche nādighi-agwu agwu, nke bu ihe nākpata ajuju, kari ikpata ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke nke di nime okwukwe: otú a ka m’nēme ub͕u a.

5 Ma ihe ezubere iweta n’iwu ahu bu ihu-n’anya sitere n’obi ọcha na ezi akọ-na-uche na okwukwe nke iru-abua nādighi ya:

6 nke madu ufọdu, ebe ha hiere ha, ha siri nime ha jehie we kwue okwu efu;

7 chọ kwa ibu ndi-ozizí nke iwu, ọ bu ezie na ha aghọtaghi ihe ha nēkwu, ha aghọtaghi kwa ihe ahu ha nēkwusi ike bayere ha.

8 Ma ayi matara na iwu ahu di nma, ma ọ buru na onye ọ bula ewere ya me ihe n’uzọ kwesiri iwu,

9 ebe ọ matara nka, na adighi-enye onye ezi omume iwu, kama anēnye ndi nēmebi iwu, ndi nēkweghi kwa idi n’okpuru iwu, nye ndi nāsọpurughi Chineke, ndi bu kwa ndi-nmehie, nye ndi nādighi ọcha n’obi, ndi emeru-kwa-ra emeru, nye ndi nēb͕u nna-ha na ndi nēb͕u nne-ha, nye ndi nēb͕u madu,

10 nye ndi nākwa iko, nye ndikom nēmeru onwe-ha n’aru ndikom, nye ndi nēzu madu n’ori, nye ndi-ugha, nye ndi nāṅu iyi ugha, ma ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di iche di nēmegide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu;

11 dika ozi ọma nke ebube nke Chineke di ngọzi si di, nke enyere mu onwem n’aka na ntukwasi-obi idebe.

12 Anamekele Onye ahu Nke merem ka m’di ike, bú Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, n’ihi na Ọ gurum n’onye kwesiri ntukwasi-obi, ebe O deberem ijere Ya ozi;

13 ọ bu ezie na abum onye nēkwulu Chineke na mbu, buru kwa onye-nsob͕u, na onye nēme madu ihe-ihere: otú ọ di, O merem ebere, n’ihi na emerem ya nāmaghi ama nime ekweghi-ekwe;

14 ma amara nke Onye-nwe-ayi, ya na okwukwe na ihu-n’anya nke di nime Kraist Jisus, riri nne nke-uku.

15 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n’uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n’uwa izọputa ndi-nmehie; ndi mu onwem bu onye-isi-ha:

16 otú ọ di, ọ bu n’ihi nka ka emerem ebere, ka o we buru nime mu onwem, bú onye-isi, ka Jisus Kraist gēgosi ogologo-ntachi-obi-Ya nile, ka m’buru ihe ilere anya n’etiti ndi gaje ikwere na Ya ka ha nata ndu ebighi-ebi.

17 Ma Eze nke mb͕e nile, Nke anāpughi imebi emebi, Nke anāpughi ihu anya, Onye nání Ya bu Chineke, nsọpuru na otuto diri Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

18 Iwu a ka m’nēnye n’aka-gi idebe, nwam Timọti, dika amuma nile si di nke eburu uzọ bu bayere gi, ka i we were ha bu agha ọma nka;

19 nēnwe okwukwe na ezi akọ-na-uche; nke ufọdu nupuru n’ebe ha nọ, ub͕ọ-ha we kpùe n’ebe okwukwe-ayi di:

20 ndi Haimeniọs na Aleksanda nọ n’etiti ha; ndi m’rara nye n’aka Setan, ka ewe site n’ahuhu zí ha ka ha ghara ikwulu Chineke.

Categories
I. TIMỌTI

I. TIMỌTI 2

1 Ya mere ihe mbu m’nādusi ọdu ike bu, ka anāriọ aririọ, kpe kwa ekpere, riọ kwa aririọ anāriọrọ ndi ọzọ, kele kwa ekele, n’ihi madu nile;

2 n’ihi ndi-eze na ndi nile nọ n’ọnọdu di elu; ka ayi we biri obi udo na nke di nwayọ nime nsọpuru-Chineke nile na ikwesi-nsọpuru nile.

3 Nka di nma buru kwa ihe agānara nke-ọma n’iru Onye-nzọputa-ayi, bú Chineke;

4 Onye nāchọ ka azọputa madu nile, ka ha biaru kwa nmazu nke ezi-okwu.

5 N’ihi na otù Chineke di, otù Onye-ob͕ub͕o di kwa n’ab͕ata Chineke na madu, Onye Ya onwe-ya bu madu, bú Kraist Jisus,

6 Onye nyere Onwe-ya ka Ọ buru ihe-nb͕aputa n’ihi madu nile; nke agāb͕a àmà-ya n’oge nke aka ya;

7 nke edebere mu onwem ka m’buru onye-nkwusa na onye-ozi ka m’we b͕a àmà ahu (anamekwu ezi-okwu, ekwughm okwu-ugha), ibu kwa onye-ozizí nke ndi mba ọzọ nime okwukwe na ezi-okwu.

8 Ya mere ezuberem ka ndikom nēkpe ekpere n’ebe nile ọ bula, nāchili aka di ọcha elu, nēweghi iwe, nārughi kwa uka.

9 Otú ahu, ezuberem ka ndinyom were ihe-ichọ-nma kwesiri ekwesi chọ onwe-ha nma, ya na nsọpuru na uche zuru okè; ọ bughi isi akpara akpa, na ọla-edo ma-ọbu pearl ma-ọbu uwe di oké ọnu-ahia;

10 kama (nke kwesiri ndinyom nēkwuputa egwu Chineke) ka ha site n’ezi ọlu chọ onwe-ha nma.

11 Ka nwanyi were nwayọ muta n’ido onwe-ya n’okpuru n’uzọ nile.

12 Ma ekweghm nwanyi ka o zí ihe, ma-ọbu ka ọ buru onye-isi n’ebe nwoke nọ, kama ka ọ nọ n’ọnọdu nwayọ.

13 N’ihi na Adam ka eburu uzọ kpu, mb͕e ahu ewe kpu Iv;

14 ọ bughi kwa Adam ka aghọrọ aghughọ, ma ebe aghọb͕uru nwanyi ọ bu nwanyi ahu ka ahuworo na ọ nọ nime njehie:

15 ma agēsite n’ọmumu-nwa-ya zọputa ya, ma ọ buru na ha anọgide nime okwukwe na ihu-n’anya na odido-nsọ, ya na uche zuru okè.

Categories
I. TIMỌTI

I. TIMỌTI 3

1 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, Ọ buru na onye ọ bula nāb͕aso ọnọdu onye nēlekọta nzukọ Kraist anya, agu ọlu ọma nāgu ya.

2 Ya mere onye nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anādighi-akalu, di nke otù nwunye, onye-anya-udo, onye uche-ya zuru okè, onye omume-ya kwesiri ekwesi, onye nēle ndi-ọbìa anya nke-ọma, onye nwere ike izí ihe;

3 onye nādighi-ese okwu site n’iṅubiga manya ókè, onye nādighi-eti madu aka; kama onye nwere obi-ọma, onye nādighi-alu ọ̀gù, onye nādighi-ahu ego n’anya;

4 onye nāchi èzí-na-ulo nke aka ya nke-ọma, nēnwe kwa umu-ya n’okpuru ya n’ikwesi-nsọpuru nile;

5 (ma ọ buru na onye ọ bula amataghi otú ọ gāchi èzí-na-ulo nke aka ya, ò gēsi aṅa le nzukọ Chineke anya nke-ọma?)

6 onye nābughi onye ọhu, ka aghara ifuli ya elu, o we dabà n’ọmuma-ikpé ekwensu.

7 Ma ọ ghaghi kwa inwe àmà di nma site n’ọnu ndi nọ n’èzí; ka ọ ghara idabà n’ita-uta, ya na ima n’ọnyà ekwensu.

8 Otú ahu ndi nējere nzukọ Kraist ozi aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nēnweghi ire abua, ndi nādighi-aṅubiga manya ókè, ndi akpiri urù nke nēweta ihere nādighi-akpọ ha nku;

9 ndi nēnwe ihe-omimi nke okwukwe-ayi nime akọ-na-uche di ọcha.

10 Ma ka eburu uzọ nwa kwa ndia; mb͕e ahu ka ha jebe ozi, ma ọ buru na ha bu ndi anāpughi ibo ebubo.

11 Otú ahu ndinyom aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nādighi-ebo madu ebubo ugha, ndi nwere anya-udo, ndi kwesiri ntukwasi-obi n’ihe nile.

12 Ka ndi nējere nzukọ Kraist ozi buru di nke otù nwanyi, nāchi umu-ha na èzí-na-ulo nke aka ha nke-ọma.

13 N’ihi na ndi jeworo ozi nke-ọma nēnwetara onwe-ha ọnọdu ọma, na oké nkwuwa-okwu nime okwukwe nke ekwere na Kraist Jisus.

14 Ihe ndia ka m’nēdegara gi n’akwukwọ, ọ bu ezie na anamele anya ibiakute gi na mb͕e ntà;

15 ma ọ buru na m’nānọ ọdù, ka i we mata otú anāghaghi ibi obi n’èzí-na-ulo Chineke, ebe ọ bu nzukọ nke Chineke di ndu, bú ide na ntọ-ala nke ezi-okwu.

16 Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n’anu-aru, Nke aguru Ya n’onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n’etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n’elu nime ebube.

Categories
I. TIMỌTI

I. TIMỌTI 4

1 Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n’oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n’ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ,

2 site n’iru-abua nke ndi nēkwu okwu-ugha, ndi eji ígwè ọku da ha n’akọ-na-uche nke aka ha;

3 ndi nēb͕ochi madu ilu di na nwunye, ndi si kwa madu erila ihe-oriri di iche iche, nke Chineke kère ka ndi kwere ekwe, ndi mazu-kwa-ra ezi-okwu, ka ndi ahu were ekele nara.

4 N’ihi na ihe nile ọ bula Chineke kère di nna, ọ dighi kwa ihe ọ bula agāju, ma ọ buru na ewere ekele nara ya:

5 n’ihi na esitere n’okwu Chineke na ekpere do ya nsọ.

6 Ọ buru na i me ka umu-nna-ayi nēchè uche n’ihe ndia, i gābu onye nējere Kraist Jisus ozi nke-ọma, ebe anāzùputa gi n’okwu nile nke okwukwe-ayi, na nke ozizí ọma ahu nke i soworo n’ukwu n’ukwu:

7 ma ju akukọ-irò nile emeruru emeru nke di-kwa-ra agadi-ndinyom. Ma nānwa onwe-gi ka i we rue nsọpuru-Chineke:

8 n’ihi na ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru-Chineke bara urù nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndu, ma nke ndu ub͕u a, ma nke gaje ibia.

9 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n’uzọ nile ọ bula.

10 N’ihi na ọ bu iru nka ka ayi nādọb͕u onwe-ayi n’ọlu, nāb͕asi kwa nb͕a ike, n’ihi na ayi elewo anya Chineke di ndu, Onye bu Onye-nzọputa madu nile, ma nke kachasinu Onye nzọputa nke ndi kwere ekwe.

11 Nēnye ihe ndia n’iwu, nēzí kwa ha.

12 Ekwela ka onye ọ bula lelìa nwata i bu anya; kama me onwe-gi ka i buru ndi kwere ekwe ihe-atù, n’okwu, n’ibi-obi, n’ihu-n’anya, n’okwukwe, n’idi-ọcha.

13 Rue mb͕e m’gābia, nāṅa nti ọgugu-akwukwọ-gi na idu-ọdu-gi na ozizí-gi.

14 Elefula onyinye-amara ahu nke di nime gi anya, nke esitere n’ibu-amuma, ya na ibikwasi-aka-n’isi nke ndi bu okenye, nye gi.

15 Nējisi ike n’ihe ndia; nānọsi ike nime ha; ka iga-n’iru-gi we puta ìhè n’ebe madu nile nọ.

16 Riba onwe-gi na ozizí-gi ama. Nānọgide n’ihe ndia; n’ihi na n’ime nka i gāzọputa onwe-gi zọputa kwa ndi nānu olu-gi.

Categories
I. TIMỌTI

I. TIMỌTI 5

1 Abarala okenye oké nba, kama nāriọ ya aririọ dika nna; nēmeso kwa umu-okorọbia dika umu-nne:

2 ndinyom, ndi bu okenye, dika ndi bu nne; umu-ab͕ọghọ dika umu-nne-nwanyi, n’idi-ọcha nile.

3 Nāsọpuru ndinyom di-ha nwuru, bú ndi nọ ezie n’ọnọdu ndinyom di-ha nwuru.

4 Ma ọ buru na nwanyi ọ bula di-ya nwuru nwere umu ma-ọbu umu umu, ka ha buru uzọ muta isọpuru Chineke n’aru ndi èzí-na-ulo nke aka ha, na inyeghachi ndi muru ha ihe: n’ihi na nka bu ihe anānara nke-ọma n’iru Chineke.

5 Ma nwanyi nke bu onye di-ya nwuru n’ezie, nke arapu-kwa-ra nání ya, ọ tukwasiwo obi-ya na Chineke, nānọgide kwa n’aririọ-ya na ekpere-ya abali na ehihie.

6 Ma nwanyi nke nādi ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-ya utọ, ọ nwuruwo mb͕e ọ nọ na ndu.

7 Nēnye kwa ihe ndia n’iwu, ka ha we buru ndi anādighi-akalu.

8 Ma ọ buru na onye ọ bula ebughi uzọ chère ndi nke aka ya ihe nākpa ha, ma nke kachasi ndi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gọnariwo okwukwe-ayi, jọkari kwa onye nēkweghi ekwe na njọ.

9 Ka aghara ide aha nwanyi ọ bula n’akwukwọ dika nwanyi di-ya nwuru nke akāb͕aghi ọgu arọ atọ, onye buworo nwunye nke otù di,

10 onye anāb͕ara ya ezi àmà n’ọlu ọma; ọ buru na ọ zùputawo umu, ọ buru na o lewo ndi-ọbìa anya nke-ọma, ọ buru na ọ sawo ukwu ndi nsọ, ọ buru na o b͕owo nkpà ndi anākpab͕u, ọ buru na o sosiwo ezi ọlu nile ọ bula ike.

11 Ma ju umu-ab͕ọghọ di-ha nwuru: n’ihi na mb͕e ọ bula ha nupuru isi n’okpuru Kraist-ayi, ha nāchọ ilu di;

12 ewe ma ha ikpé, n’ihi na ha juru okwukwe mbu ha.

13 Ma tukwasi ihe ndia ha nāmuta kwa ibu ndi nādighi-alu ọlu, nēje n’ulo di iche iche; ma ọ bughi nání na ha bu ndi nādighi-alu ọlu, kama ha bu kwa ndi nēkwu okwu nzuzu, buru kwa ndi nētiye aka n’ọlu nābughi nke aka ha, nēkwu okwu nēkwesighi ka ha kwu.

14 Ya mere anamezube ka umu-ab͕ọghọ ndi di-ha nwuru luru di, mu kwa umu, nāchi kwa èzí-na-ulo-ha, ghara kwa inye onye nēmegide ayi ihe o gēji kwutọ:

15 n’ihi na ufọdu ejehiewo uzọ so Setan ub͕u a.

16 Ọ buru na nwanyi ọ bula nke kwere ekwe nwere ndinyom di-ha nwuru, ya b͕o ha nkpà, ka aghara kwa ibob͕u nzukọ Kraist; ka o we b͕o ndi ahu nkpà, bú ndi nọ n’ezie n’ọnọdu ndinyom di-ha nwuru.

17 Ka agua ndi-okenye na ndi kwesiri nsọpuru okpukpu abua, bú ndi nāchi isi nke-ọma, ma nke kachasinu ndi nādọb͕u onwe-ha n’ọlu nime okwu Chineke na ozizí.

18 N’ihi na ihe edeworo n’akwukwọ nsọ nāsi, Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka. Na, Onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya.

19 Anarala ebubo anēbo okenye, ma-ọbughi n’ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ.

20 Nātu ndi nēmehie nmehie-ha n’anya n’iru madu nile, ka ndi fọduru we tu kwa egwu.

21 Anamagwasi gi ike n’iru Chineke, na n’iru Kraist Jisus, na n’iru ndi-mọ-ozi arọputara, ka i debe iwu ndia, ghara ima ikpé mb͕e i kānughi, ghara kwa ime ihe ọ bula n’uzọ isọ-anya.

22 Ebikwasila onye ọ bula aka n’isi ọsọsọ, eso-kwa-la ndi ọzọ nwekọ nmehie-ha: debe onwe-gi ọcha.

23 Abu-kwa-la onye nāṅu nání miri ọzọ, kama nāṅu nwantinti manya-vine n’ihi afọ-gi na nriaria nke nāria gi ọtutu mb͕e.

24 Nmehie madu ufọdu nāputa ìhè, n’ihi na ha buru ha uzọ nāga ikpé; ma nmehie madu ufọdu nēso kwa ha n’azu.

25 Otú ahu, ọlu nile nke di nma nāputa kwa ìhè; apughi kwa izobe ọlu nke di iche.

Categories
I. TIMỌTI

I. TIMỌTI 6

1 Ka ha ra, bú ndi-orù nke nọ n’okpuru yoke, ha gua ndi-nwe-ha na ndi kwesiri nsọpuru nile, ka ewe ghara ikwulu aha Chineke na ozizí-ayi.

2 Ma ndi nwere ndi kwere ekwe dika ndi-nwe-ha, ka ha ghara ilelì ha anya, n’ihi na ha bu umu-nna-ha; kama ka ha buru orù-ha kari, n’ihi na ndi soro ha ke òkè n’ọlu ọma ha bu ndi kwere ekwe na ndi ahuru n’anya. Nēzí ihe ndia nādu kwa madu ọdú bayere ha.

3 Ọ buru na onye ọ bula nēzí ihe di iche, nēkweyeghi kwa n’okwu nēnye ezi ndu, bú okwu nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ozizí ahu nke di ka nsọpuru-Chineke si di;

4 afuliwo ya elu, ọ dighi ihe ọ mara, kama ọria bayere ajuju na esem-okwu n’ihi okwu efu nāria ya, nke ekworo, esem-okwu, nkwulu, ajọ èchìchè, nēsi nime ha nāputa,

5 bú iru-uka nke madu ndi mebiworo n’uche, ndi apunarawo-kwa-ra ha ezi-okwu, ebe ha nāgu na nsọpuru-Chineke bu uzọ irita urù.

6 Ma nsọpuru-Chineke, ya na inwezu ihe nile di nkpà, bu uzọ irita urù nke-uku;

7 n’ihi na ayi ewetaghi ihe ọ bula n’uwa, ọ bu kwa n’ihi na ayi apughi iwere ihe ọ bula pua nime ya;

8 ma ebe ayi nwere ihe-oriri na ihe ib͕okwasi n’aru, afọ gēju ayi n’ihe ndia.

9 Ma ndi nēzube ibu ọgaranya nādabà n’ọnwunwa na ọnyà na ọtutu agu ihe ọjọ nke uche nādighi nime ha, nke nēmeru kwa aru, bú ihe nēme ka madu mikpù emikpù nime nbibi na ila-n’iyì.

10 N’ihi na ihu ego n’anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche: nke ufọdu nāb͕asosi ike, ewe duhie ha n’okwukwe-ayi, ha were kwa ọtutu ihe-nb͕u dupue onwe-ha.

11 Ma gi onwe-gi, onye nke Chineke, nāb͕anari ihe ndia; ma nāb͕aso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ihu-n’anya, ntachi-obi, idi-nwayọ.

12 Nāb͕asi nb͕a ọma nke okwukwe ike, jide ndu ebighi-ebi aka nke akpọrọ gi ka i nata ya, i kwuputa-kwa-ra nkwuputa ọma ahu n’iru ọtutu ndi-àmà.

13 Anamenye gi iwu n’iru Chineke, Onye nēme ka ihe nile di ndu, ya na n’iru Kraist Jisus, Onye b͕ara àmà nkwuputa ọma ahu n’iru Pọntiọs Pailat;

14 ka gi onwe-gi debe ihe ahu enyere n’iwu, nēnweghi ntupọ, onye anādighi-akalu akalu, rue ngosi nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist:

15 nke Ọ gēgosi n’oge nke aka Ya, Onye nání Ya bu Onye di ike, Onye bu kwa onye di ngọzi, bú Eze kachasi ndi bu eze, Onye bu kwa Onye-nwenu kachasi ndi nāchi ka ndi-nwe madu;

16 Onye nání Ya nwere anwughi-anwu, nēbi nime ìhè nke anāpughi ibiaru nso; Onye ọ dighi madu ọ bula huworo Ya anya, ma-ọbu pu ihu Ya anya: Onye nsọpuru na ike ebighi-ebi diri. Amen.

17 Nēnye ndi bu ọgaranya n’oge di ub͕u a iwu, ka ha ghara itukwasi uche-ha n’ihe di elu, ghara kwa itukwasi obi n’ihe ahu anējighi aka, bú àkù, kama ka ha tukwasi obi na Chineke, Onye nēwere àkù-Ya nye ayi ihe nile ka ha buru ihe gātọ ayi utọ;

18 ka ha nēme ezi ihe, ka ha buru ọgaranya n’ọlu ọma nile, ka ha buru ndi kwadebeworo ime ka ndi ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha buru ndi kwere ka ndi ọzọ so ha nwekọ ihe;

19 ka ha kpadoro onwe-ha ntọ-ala ọma nye oge gaje ibia, ka ha we jide ndu ahu nke bu ndu n’ezie.

20 Biko Timọti, nēche ihe ahu enyere gi n’aka idebe, nēze okwu efu nile nke emeruru emeru nke ihe ahu anākpọ ihe-ọmuma n’uzọ ugha, ha na nguzogide-ya nile;

21 bú ihe-ọmuma nke ufọdu kwuputara we hie n’ihe bayere okwukwe-ayi.

Ka amara diyere unu.