Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 21

1 Devid we biarue Nob biakute Ahimelek, bú onye-nchu-àjà: Ahimelek we ma jijiji izute Devid, si ya Gini mere nání gi onwe-gi biara, ma ọ dighi nwoke gi na ya yikọrọ?

2 Devid we si Ahimelek, bú onye-nchu-àjà, Eze enyewom ihe n’iwu, sim, Ka nwoke ọ bula ghara ima ihe ọ bula bayere ihe ahu nke mu onwem nēziga gi ozi-ya, na nke m’nyeworo gi n’iwu: emewokwam ka umu-okorọbiam mara na ha gēje n’ebe di otú a otú a.

3 Ma ub͕u a gini di n’okpuru aka-gi? nyem ob͕e achicha ise n’aka, ma-ọbu ihe agāchọta.

4 Onye-nchu-àjà ahu we za Devid, si, Ọ dighi achicha anēdoghi nsọ di n’okpuru akam, ma achicha nsọ di; nání ọ buru na umu-okorọbia ahu edebewo onwe-ha ghara imetu nwayi aru.

5 Devid we za onye-nchu-àjà, si ya, N’ezie, ọ buru na eb͕ochiwo ndinyom n’imetu ayi aru, dika na mb͕e gara aga mb͕e m’nāputa, ihe umu-okorọbia we di nsọ, ma nke ahu bu ije nke anēdoghi nsọ; ìhe-ha gēsi kwa aṅa ghara idi nsọ kari ta?

6 Onye-nchu-àjà we nye ya achicha nsọ: n’ihi na ọ dighi achicha di n’ebe ahu ma-ọbughi achicha nke iru Chineke, nke anēwezuga n’iru Jehova, idọba achicha di ọku n’elu table n’ubọchi ewepuru ya.

7 Ma otù nwoke n’etiti ndi-orù Sọl nọ n’ebe ahu n’ubọchi ahu, onye anēb͕ochi ka ọ ghara ipu n’iru Jehova; aha-ya bu Doeg, onye Edom, onye kachasi ike n’etiti ndi-ọzùzù anu-ulo ndi Sọl nwere.

8 Devid we si Ahimelek, Ọ̀ dighi kwa ube ma-ọbu mma-agha di n’ebe a n’okpuru aka-gi? n’ihi na ewetaghm ma mma-agham ma ihe-agham, n’ihi na okwu a nke eze bu ihe di ọku ọku.

9 Onye-nchu-àjà we si, Mma-agha Gọlaiat, bú onye Filistia, onye i tib͕uru na ndagwurugwu Ila, le, nke ahu di, afuchiworo ya n’ákwà n’azu ephod: ọ buru na i gēwere nke ahu, were ya: n’ihi na ọ dighi ọzọ di n’ebe a ma-ọbughi ya. Devid we si, Ọ dighi nke di ka ya; nyem ya.

10 Devid we bilie, b͕apu n’ubọchi ahu n’iru Sọl, bakuru Ekish, bú eze Gat.

11 Ndi-orù Ekish we si ya, Ọ̀ bughi Devid, bú eze ala ahu, bu nka? ọ̀ bughi ihe bayere nwoke a ka ha zaritara onwe-ha n’ite-egwú, si,

Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri,

Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise?

12 Devid we tiye okwu ndia n’obi-ya, tua egwu Ekish, bú eze Gat, nke-uku.

13 O we b͕anwe omume-ya n’anya-ha, me onwe-ya dika onye anya-ya nādighi nma n’aka-ha, ọ ka kwa akàrà n’ibo ọnu-uzọ-ama, nāgusisi kwa ọnu-miri-ya n’afu-ọnu-ya.

14 Ekish we si ndi-orù-ya, Le, unu nāhu nwoke a ka o nēme onwe-ya dika onye nāwi ara: n’ìhi gini ka unu mere ka ọ biakutem?

15 Ndi nke akam nāwi ara, hà kọrọm ukọ, na unu emewo ka nwoke a bata ime onwe-ya dika onye nāwi ara n’irum? Nwoke a, ọ̀ gābata n’ulom?

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 22

1 Devid we si n’ebe ahu je, wepuga onwe-ya rue ọb͕à Adulam: umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we nu ya, ha we ridakuru ya n’ebe ahu.

2 Ha we chikọta onwe-ha n’ebe ọ nọ, bú nwoke ọ bula nke nọ na nkpab͕u, na nwoke ọ bula nke nwere onye ọ nara ego n’ọmuru-nwa, na nwoke ọ bula nkpuru-obi-ya di ilu; o we buru onye-isi-ha: ihe ra ka nnù ndikom we nọ n’aka-ya.

3 Devid we si n’ebe ahu je rue Mizpe Moab: ọ si eze Moab, Biko, ka nnam na nnem puta, nọ n’etiti unu, rue mb͕e m’mara ihe Chineke gēmerem.

4 O we duru ha bia n’iru eze Moab: ha we biri n’aka-ya ubọchi nile Devid nọ n’ebe ahu ewusiri ike.

5 Gad, bú onye-amuma, we si Devid, Anọdula n’ebe a ewusiri ike; je, bara onwe-gi n’ala Juda. Devid we je, ba n’oké ọhia Heret.

6 Sọl we nu na amatara ihe bayere Devid na ndikom ya na ha nọ: ma Sọl nānọdu na Gibea, n’okpuru osisi tamarisk na Rema, ube-ya di kwa n’aka-ya, ndi-orù-ya nile nēguzo n’akuku ya.

7 Sọl we si ndi-orù-ya ndi nēguzo n’akuku ya, Biko, nurunu, unu ndi Benjamin; ọ̀ bu kwa unu nile ka nwa Jesi gēnye ubi na ubi-vine, ọ̀ bu unu nile ka ọ gēdo ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise?

8 na unu nile ekekọtawo onwe-unu imegidem, ọ dighi kwa onye nēkpughepu ntim ka m’nu ya mb͕e nwam na nwa Jesi b͕ara ndu, ọ dighi kwa onye nime unu ọ nēb͕u nb͕u n’obi n’ihim, ma-ọbu nke nēkpughepu ntim ka m’nu na nwam emewo ka orùm bilie imegidem, iche anwu, dika ta.

9 Doeg onye Edom we za, (n’ihi na ya onwe-ya nēguzo n’akuku ndi-orù Sọl), si, Ahurum nwa Jesi ka ọ nābiaru Nob, biakute Ahimelek nwa Ahaitub.

10 O we juara ya ase n’aka Jehova, nye ya ihe ọ gēri n’uzọ, nye kwa ya mma-agha Gọlaiat onye Filistia.

11 Eze we ziga ikpọ Ahimelek nwa Ahaitub, bú onye-nchu-aja, na ulo nna-ya nile, bú ndi-nchu-àjà ndi nọ na Nob: ha we biakute eze, ha nile.

12 Sọl we si, Biko, nuru, gi nwa Ahaitub. O we si, Lem, onye-nwem.

13 Sọl we si ya, N’ìhi gini ka unu kekọtaworo onwe-unu imegidem, gi onwe-gi na nwa Jesi, n’inye ya achicha na mma-agha, na n’ijuru ya ase n’aka Chineke, ka o we bilie imegidem, iche anwu, dika ta?

14 Ahimelek we za eze, si, Ònye kwa n’etiti orù-gi nile di ka Devid? ọ bu onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa di nwa eze, o wezugawo kwa onwe-ya ibà n’etiti ndi nānu okwu-gi, ọ di kwa nsọpuru n’ulo-gi.

15 Ọ̀ bu ta ka m’malitere ijuru ya ase n’aka Chineke? ya burum ihe-árú: ka eze ghara ibo orù-ya ebubo ọ bula, ghara kwa ibo ulo nnam nile: n’ihi na orù-gi amaghi ihe ọ bula n’ihe a nile, nke di ntà ma-ọbu nke di uku.

16 Eze we si, I ghaghi inwu, Ahimelek, gi onwe-gi na ulo nna-gi nile.

17 Eze we si ndi-ọb͕a-ọsọ ndi nēguzo n’akuku ya, Chigharianu, me ka ndi-nchu-àjà Jehova nwua; n’ihi na aka-ha di kwa n’akuku Devid, na n’ihi na ha mara na onye nāb͕apu ka ọ bu, ma ha ekpughepughi ntim ka m’nu ya. Ma ndi-orù eze ekweghi isetipu aka-ha idakwasi ndi-nchu-àjà Jehova.

18 Eze we si Doeg, Gi onwe-gi chigharia, dakwasi ndi-nchu-àjà. Doeg onye Edom we chigharia, ya onwe-ya we dakwasi ndi-nchu-àjà, me ka ọgu ndikom anọ na ise nwua n’ubọchi ahu, bú ndi nēyi ephod nke ákwà ọcha.

19 O were kwa ọnu mma-agha tib͕ue Nob, bú obodo ndi-nchu-àjà, were ọnu mma-agha tib͕ue ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, na ehi na inyinya-ibu na aturu.

20 Ma otù nwa-nwoke nke Ahimelek nwa Ahaitub nwere, aha-ya bu Abaiata, wepugara onwe-ya, b͕apu soro Devid.

21 Abaiata we gosi Devid na Sọl eb͕uwo ndi-nchu-àjà Jehova.

22 Devid we si Abaiata, Amaram n’ubọchi ahu, mb͕e Doeg, bú onye Edom, nọ n’ebe ahu, na ọ ghaghi igosi Sọl: mu onwem akpatawo ọnwu nke madu nile nke ulo nna-gi.

23 Ka mu na gi nọdu, atula egwu; n’ihi na onye ahu nke nāchọ ndum nāchọ ndu-gi: n’ihi na ihe-ndebe ka i bu n’akam.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 23

1 Ha we gosi Devid, si, Le, ndi Filistia nēbuso Keila agha, ndi ahu nāpunara ha ebe-nzọcha-ọka nile ha.

2 Devid we jua Jehova ase, si, M’gēje tib͕ue ndi Filistia ndia? Jehova we si Devid, Je, tib͕ue ndi Filistia, zọputa Keila.

3 Ndikom Devid we si ya, Le, ayi onwe-ayi nātu egwu n’ebe a nime Juda: àyi gēsi kwa aṅa ghara itu egwu kari mb͕e ayi gēje Keila, rue usoro-agha nile nke ndi Filistia?

4 Devid we ju kwa Jehova ase ọzọ. Jehova we za ya, si, Bilie, rida rue Keila; n’ihi na Mu onwem nēnye ndi Filistia n’aka-gi,

5 Devid na ndikom-ya we jerue Keila, buso ndi Filistia agha, kpuru anu-ulo-ha, tib͕ue ha ntib͕u uku. Devid we zọputa ndi bi na Keila.

6 O rue, mb͕e Abaiata nwa Ahimelek b͕akuru Devid rue Keila, na ọ chiri ephod n’aka-ya rida.

7 Ewe gosi Sọl na Devid abàwo na Keila. Sọl we si, Chineke ajuwo ya, rapu ya n’akam; n’ihi na emechibidowo ya nime, n’ibà n’obodo nwere ibo ọnu-uzọ-ama na nkpọrọ.

8 Sọl we me ka ndi Israel nile nuru na ha gēje agha, iridaru Keila, inọchigide Devid na ndikom-ya n’agha.

9 Devid we mara na ọ bu ya ka Sọl nēcheputa ihe ọjọ megide; o we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, Chita ephod nso.

10 Devid we si, Jehova, bú Chineke Israel, orù-Gi anuwo n’ezie na Sọl nāchọ ibiaru Keila, ibibi obodo a n’ihim.

11 Ndi-nwe Keila, ha gēmechibidom nye n’aka-ya? Sọl, ọ̀ gāridata, dika orù-Gi nuworo? Jehova, bú Chineke Israel, biko, gosi orù-Gi. Jehova we si, Ọ gāridata.

12 Devid we si, Ndi-nwe Keila, hà gēmechibidom na ndikom nkem nye n’aka Sọl? Jehova we si, Ha gēmechibido gi nye.

13 Devid na ndikom-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri, we bilie, si na Keila pua, ha we nējeghari ebe ha huru uzọ ijeghari. Ewe gosi Sọl na Devid esiwo na Keila wepuga onwe-ya; o we ghara iputa.

14 Devid we nọdu n’ọzara n’ebe ewusiri ike, o we nọdu n’ugwu n’ọzara Zif. Sọl we nāchọ ya ubọchi nile, ma Chineke enyeghi ya n’aka-ya.

15 Devid we hu na Sọl aputawo ichọ ndu-ya: ma Devid nọ n’ọzara Zif n’oké ọhia.

16 Jonatan nwa Sọl we bilie, jekuru Devid n’oké ọhia ahu, me ka aka-ya di ike nime Chineke.

17 Ọ si ya, Atula egwu: n’ihi na aka nnam, bú Sọl, agaghi-achọta gi; gi onwe-gi gābu kwa eze Israel, mu onwem gābu-kwa-ra gi onye nke-abua; ọzọ kwa, Sọl, bú nnam, mara nka.

18 Ha abua we b͕a ndu n’iru Jehova: Devid we nọdu n’oké ọhia, ma Jonatan lara n’ulo-ya.

19 Ndi Zif we rigokuru Sọl rue Gibea, si, Devid, ò zoghi onwe-ya n’etiti ayi n’ebe ewusiri ike n’oké ọhia, n’ugwu ntà Hakila, nke di na Ndida nke ala ahu nke tọb͕ọrọ n’efu?

20 Ma ub͕u a, eze, dika agu nile nke nāgu nkpuru-obi-gi iridata si di, ridata; ọ diri ayi imechibido ya nye n’aka eze.

21 Sọl we si, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu; n’ihi na unu enwewo ọmiko n’arum.

22 Biko, lanu, dozi-kwa-nu ọzọ, mára hu kwa ọnọdu-ya ebe ukwu-ya di, na onye huworo ya n’ebe ahu: n’ihi na agwawom na ya onwe-ya nāghọ aghughọ nke-uku.

23 Ma hunu, we mara ebe-izo-nzuzo nile ebe o nēzo onwe-ya, unu biaghachikutekwam mb͕e unu dozisiri onwe-unu, m’gēso kwa unu je: o gēru kwa, ọ buru na ọ nọ n’ala nka, na m’gāchọputa ya n’usu nnù ndikom Juda abua na ọgu iri nile.

24 Ha we bilie, jerue Zif n’iru Sọl: ma Devid na ndikom-ya di n’ọzara Maon, n’Araba, na Ndida nke ala ahu tọb͕ọrọ n’efu.

25 Sọl na ndikom-ya we je ichọ ya. Ha we gosi Devid: o we rida rue nkume ahu di elu, nọdu n’ọzara Maon. Sọl we nu ya, chua Devid n’azu n’ọzara Maon.

26 Sọl we je n’otù akuku ugwu, Devid na ndikom-ya n’akuku nke-ọzọ nke ugwu ahu: Devid we zọlie ọsọsọ ib͕apu n’iru Sọl; ma Sọl na ndikom-ya nāb͕a Devid na ndikom-ya buruburu inwude ha.

27 Ma onye-ozi biakutere Sọl, si, Me ngwa, lata; n’ihi na ndi Filistia amadewo imegide ala-ayi.

28 Sọl we si n’ichu Devid n’azu laghachi, je izute ndi Filistia: n’ihi ya ka ha kpọrọ ebe ahu Sela-hamahlekot.

29 Devid we si n’ebe ahu rigo, nọdu n’ebe ewusiri ike nke En-gedi.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 24

1 O rue, mb͕e Sọl siri n’iso ndi Filistia lata, na egosiri ya, si, Le, Devid nọ n’ọzara En-gedi.

2 Sọl we chiri nnù ndikom asa na ọgu iri arọputara n’Israel nile, ọ je ichọ Devid na ndikom-ya n’elu oké nkume nke ewu-ọhia.

3 Ọ biarue ogige ìgwè ewu na aturu n’uzọ, ọb͕à di kwa n’ebe ahu; Sọl we ba ikpuchi ukwu-ya. Ma Devid na ndikom-ya nānọdu n’akuku ime ọb͕à ahu.

4 Ndikom Devid we si ya, Le, ubọchi nke Jehova siri gi, Le, Mu onwem nēnye onye-iro-gi n’aka-gi, i gēme kwa ya dika o si di nma n’anya-gi. Devid we bilie, were nzuzo bipu ọnu-ọnu uwe-nwuda nke Sọl nwere.

5 O rue, ka emesiri, na obi Devid tara ya uta, n’ihi na o bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda Sọl nwere.

6 Ọ si ndikom-ya, Ya burum ihe-árú site na Jehova; m’gaghi-eme onye-nwem, bú onye Jehova etere manu, ihe a ma-ọli, bú iseti akam megide ya, n’ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.

7 Devid we were okwu ndia b͕ochie ndikom-ya, o kweghi kwa ka ha bilie imegide Sọl. Sọl we si n’ọb͕à ahu bilie, je ije-ya.

8 Devid we bilie ka emesiri, si n’ọb͕à ahu pua, kpọ òkù n’azu Sọl, si, Onye-nwem eze. Sọl we legide anya n’azu-ya, Devid we rube iru-ya n’ala, kpọ isi ala.

9 Devid we si Sọl, N’ìhi gini ka i nēge nti okwu madu, si, Le, Devid nāchọ imejọ gi?

10 Le, ubọchi ta ka anya-gi abua huworo otú Jehova nyere gi n’akam ta n’ọb͕à: ewe si ka m’b͕ue gi: ma anyam mere gi ebere; m’we si, M’gaghi-eseti akam megide onye-nwem, n’ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.

11 Ma, nnam, le, e, le ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n’akam: n’ihi na nime nbipu m’bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi, ma eb͕ughm i, gi mara hu kwa na ọ dighi ihe ọjọ ma-ọbu njehie di n’akam, emehieghkwam megide gi; ma gi onwe-gi nāchu ntá nkpuru-obim iwere ya.

12 Jehova kpe ikpe n’etiti mu na gi, Jehova bọ-kwa-ram ọ́bọ̀ n’aru gi: ma akam agaghi-adi n’aru gi.

13 Dika ilu ndi mb͕e mbu nāsi, Na ndi nēmebi iwu ka nmebi-iwu si aputa: ma akam agaghi-adi n’aru gi.

14 Ònye ka eze Israel putaworo iso n’azu? ònye ka i nāchu n’azu? ọ bu n’azu nkita nwuru anwu, n’azu otù igwu.

15 Ma Jehova buru onye-ikpe, kpe ikpe n’etiti mu na gi, Ya hu kwa, kpe ọnum n’ikpe, kpeputam n’aka-gi.

16 O rue, mb͕e Devid gwabìri Sọl okwu ndia, na Sọl siri, Ọ̀ bu olu-gi, bú nka, nwam Devid? Sọl we welie olu-ya, kwa ákwá.

17 Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n’ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ.

18 Gi onwe-gi egosiwo ta na i mewo ezi ihe n’ebe m’nọ: n’ihi na mb͕e Jehova mechibidorom nye n’aka-gi, i b͕ughm.

19 Ma mb͕e madu gāchọta onye-iro-ya, ò gēzilaga kwa ya n’ezi uzọ? Jehova kwughachi kwa gi ezi ihe n’ọnọdu ihe a i meworom ta.

20 Ma ub͕u a, le, amawom na i ghaghi ibu eze, na agēme kwa ka ala-eze Israel guzosie ike n’aka-gi.

21 Ma ub͕u a were Jehova ṅuaram iyi, na i gaghi-ebipu nkpurum gānọchim n’azu, na i gaghi-ekpochapu aham n’ulo nnam.

22 Devid we ṅuara Sọl iyi. Sọl we laghachi; ma Devid na ndikom-ya rigoro n’ebe ahu ewusiri ike.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 25

1 Samuel we nwua; Israel nile we chikọta onwe-ha, tiere ya aka n’obi, lìe ya n’ulo-ya na Rema. Devid we bilie, rida rue ọzara Peran.

2 Ma otù nwoke bi na Maon, nke ọlu ọ nālu di na Kamel; nwoke ahu di kwa nọ̄ uku, ọ nwe-kwa-ra nnù aturu asa na ọgu iri, na nnù ewu abua na ọgu iri: ọ we nọ n’ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya na Kamel.

3 Ma aha nwoke ahu bu Nebal; aha nwunye-ya bu Abigail: nwayi ahu nwere ezi uche, ma kwa nma n’aru: ma nwoke ahu siri ike n’obi, jọ kwa njọ n’omume nile; ya onwe-ya bu kwa onye Keleb.

4 Devid we nu n’ọzara na Nebal nākpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya.

5 Devid we ziga umu-okorọbia iri, Devid we si umu-okorọbia ahu, Rigoruenu Kamel, bakuru Nebal, jua ya ajuju bayere udo-ya n’aham,

6 si kwa ya otú a, Ndu-gi! gi onwe-gi, udo; ulo-gi, udo kwa; ihe nile i nwere, udo kwa.

7 Ma ub͕u a anuwom na i nwere ndi nākpacha aji anu: ub͕u a ayi na ndi-ọzùzù-aturu i nwere anọwo, ayi emeghi ka ihere me ha, ọ dighi kwa ihe ọ bula ha lere anya ya na o furu efu, ubọchi nile ha nọ na Kamel.

8 Jua umu-okorọbia-gi, ha gēgosi kwa gi: ka umu-okorọbia huta kwa amara n’iru gi; n’ihi na ọ bu n’ezi ubọchi ka ayi biaworo: biko, nye ndi-orù-gi, nye kwa nwa-gi Devid, ihe aka-gi gāchọta.

9 Umu-okorọbia Devid we bata, gwa Nebal okwu n’aha Devid dika okwu ndia nile si di, we nọdu du.

10 Nebal we za ndi-orù Devid, si, Ònye bu Devid? ònye bu kwa nwa Jesi? ọtutu orù di ta ndi nētiwapu onwe-ha, onye ọ bula n’aka onye-nwe-ya.

11 M’gēwere kwa achicham na mirim na anum eb͕uru eb͕u nke m’b͕uworo bayere ndim nākpacha aji anu, nye ndikom ndi m’nāmaghi ebe ha si bia?

12 Umu-okorọbia Devid we chigharia n’uzọ-ha, lata, bia gosi ya dika okwu ndia nile si di.

13 Devid we si ndikom-ya, Kenu, nwoke ọ bula mma-agha-ya n’úkwù-ya. Ha we ke, nwoke ọ bula mma-agha-ya, n’úkwù; Devid we ke kwa mma-agha-ya n’úkwù: ihe ra ka nnù ndikom we soro Devid n’azu rigo; ọgu ndikom iri we nọdu n’ebe ihe-ha di.

14 Ma otù okorọbia nime umu-okorọbia Nebal gosiri Abigail, bú nwunye Nebal, si, Le, Devid siri n’ọzara zite ndi-ozi igọzi onye-nwe-ayi; o we makwasi ha.

15 Ma ndikom ahu di nma nke-uku ka ha si me ayi, emeghi kwa ka ihere me ayi, ọ dighi kwa ihe ọ bula ayi lere anya ya na o furu efu n’ubọchi nile ayi na ha nējeghari, mb͕e ayi nọ n’ọhia:

16 ha buru ayi mb͕idi ma abali ma ehihie, ubọchi nile ayi na ha nọ mb͕e ayi nāzù ìgwè ewu na aturu.

17 Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n’ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu.

18 Abigail we me ngwa, chiri ọgu ob͕e achicha iri, na karama-akpukpọ abua nke manya-vine juru nime ha, na aturu ise edoziri edozi, na mb͕é ọka aṅara aṅa ise, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu mbadamba fig iri, we bo ha inyinya-ibu.

19 Ọ we si umu-okorọbia-ya, Gabiganu n’irum; le, m’nābia n’azu unu. Ma o gosighi di-ya, bú Nebal.

20 O rue, mb͕e inyinya-ibu nēbu nwayi ahu ga, mb͕e ọ nārida kwa n’ebe-nzuzo nke ugwu ahu, le, Devid na ndikom-ya nārida izute ya; o we zute ha.

21 Ma Devid siri, Nání n’efu ka m’debeworo ihe nile nke nwoke a nwere n’ọzara, ọ dighi kwa ihe ọ bula elere anya ya na o furu efu n’ihe nile o nwere: o we nyeghachim ihe ọjọ n’ọnọdu ezi ihe.

22 Chineke me ndi-iro Devid otú a, me kwa ha ihe ọzọ otú a, ọ buru na emem ka nwoke ọ bula fọdu rue ìhè ututu n’etiti ndi nile o nwere.

23 Abigail we hu Devid, me ngwa, si n’inyinya-ibu-ya rida, da kpue iru-ya n’ala n’iru Devid, kpọ isi ala.

24 O we da n’ala n’ukwu-ya, si, Onye-nwem, ka ajọ omume ahu dikwasi mu onwem: ma biko, ka orù-gi nwayi kwue na nti-gi, gi nuru kwa okwu nile nke orù-gi nwayi.

25 Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n’aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n’ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n’aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere.

26 Ma ub͕u a, onye-nwem, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, ebe Jehova b͕ochiworo gi ka i ghara ibà n’ikpe-ọmuma ọbara, ka aka-gi ghara kwa izọputa gi, ub͕u a kwa ka ndi-iro-gi na ndi nāchọ ime onye-nwem ihe ọjọ di ka Nebal.

27 Ma ub͕u a ngọzi a nke nwayi nējere gi ozi wetaworo onye-nwem, ka enye ya umu-okorọbia ndi nēso onye-nwem n’ukwu n’ukwu jeghari.

28 Biko, b͕aghara njehie orù-gi nwayi: n’ihi na Jehova aghaghi imere onye-nwem ulo kwesiri ntukwasi-obi, n’ihi na ọ bu agha nile nke Jehova ka onye-nwem nēbu; agaghi-ahuta kwa ihe ọjọ n’aru gi ubọchi-gi nile.

29 Ọ bu kwa ezie na madu biliri ichu gi, na ichọ nkpuru-obi-gi: ma agēke nkpuru-obi onye-nwem na ngugu nke ndi di ndu n’aka Jehova, bú Chineke-gi; ma nkpuru-obi ndi-iro-gi, ha ka Ọ gēsi n’etiti oghere èbè-Ya mapu.

30 O gēru kwa, mb͕e Jehova gēmewori nye onye-nwem dika ezi ihe nile si di nke O kwuworo bayere gi, mb͕e Ọ gēnyewo kwa gi-ri iwu ibu onye-ndú Israel;

31 na nka agaghi-aburu gi ihe-nṅaghari, ọ gaghi-aburu kwa onye-nwem ihe-isu-ngọngọ obi, na i wusiwo ọbara n’efu, ma-ọbu na onye-nwem azọputawo onwe-ya: ma mb͕e Jehova gēmewori onye-nwem nma, i gēcheta kwa orù-gi nwayi.

32 Devid we si Abigail, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye zitere gi ta izutem:

33 ihe agọziri agọzi ka ezi uche-gi bu kwa, onye agọziri agọzi ka i bu kwa, onye b͕ochiworom ta ka m’ghara ibà n’ikpe-ọmuma ọbara, ka akam ghara kwa izọputam.

34 Ma otú ọ di, Jehova, bú Chineke Israel nādi ndu, Onye b͕ochiworom ka m’ghara imejọ gi, n’ezie ọ buru na i meghi ngwa bia izutem, agaghi-eme ka nwoke fọduru Nebal ma-ọli rue ìhè ututu.

35 Devid we nara n’aka-ya ihe o wetara ya: ọ si ya, Rigorue ulo-gi n’udo; le, egewom nti olu-gi, hu kwa gi iru-ọma.

36 Abigail we biakute Nebal; ma, le, o nwere oké oriri n’ulo-ya, dika oké oriri eze; obi Nebal we di nma nime ya, ọ ṅubiga-kwa-ra manya okè nke-uku: Abigail we ghara igosi ya okwu ọ bula, okwu ntà ma-ọbu okwu uku, rue ìhè ututu.

37 O rue, n’ututu, mb͕e manya-vine puworo n’anya Nebal, na nwunye-ya gosiri ya okwu ndia, obi-ya we nwua n’etiti ya, ya onwe-ya we di ka nkume.

38 O rue, mb͕e ihe ra ka ubọchi iri gabigara, na Jehova tib͕uru Nebal, o we nwua.

39 Devid we nu na Nebal anwuruwo, ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye kpere ọnu ihe-ita-utam n’ikpé, me ka m’pua n’aka Nebal, O we b͕ochie orù-Ya ka ọ ghara ime ihe ọjọ: ma ihe ọjọ Nebal ka Jehova meworo ka ọ lata n’isi-ya. Devid we ziga kwue okwu bayere Abigail, iluta ya n’onwe-ya na nwunye.

40 Ndi-orù Devid we biakute Abigail rue Kamel, gwa ya okwu, si, Devid ezitewo ayi biakute gi ilutara ya gi onwe-gi na nwunye.

41 O we bilie, kpọ isi ala, kpue iru-ya n’ala, si, Le, orù-gi nwayi bu nwayi nēje ozi isa ukwu ndi-orù onye-nwem.

42 Abigail we me ngwa, bilie, nọkwasi n’inyinya-ibu, ya na umu-ab͕ọghọ-ya ise ndi nējeso ya n’ukwu n’ukwu; o we nējeso ndi-ozi Devid n’azu, ghọrọ ya nwunye.

43 Devid kuru-kwa-ra Ahinoam nke Jezreel; ha we ghọrọ ya nwunye, ọbuná ha abua.

44 Ma Sọl were Maikal nwa-ya, bú nwunye Devid, nye Palti nwa-nwoke Laish, onye sitere na Galim.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 26

1 Ndi Zif we biakute Sọl rue Gibea, si, Devid, ọ̀ dighi-ezo onwe-ya n’ugwu ntà Hakila, nke di n’iru ala ahu nke tọb͕ọrọ n’efu?

2 Sọl we bilie, rida rue ọzara Zif, ya na nnù ndikom asa na ọgu iri, ndi arọputara nke Israel, ichọ Devid n’ọzara Zif.

3 Sọl we ma ulo-ikwū-ya n’ugwu ntà Hakila, nke di n’iru ala ahu nke tọb͕ọrọ n’efu, n’akuku uzọ. Ma Devid nānọdu n’ọzara, ọ hu na Sọl abiawo, nēso ya n’azu rue ọzara.

4 Devid we ziga ndi-nledo, mara na Sọl abiawo n’ebe o dozisiri onwe-ya.

5 Devid we bilie, biarue ebe Sọl mara ulo-ikwū-ya: Devid we hu ebe ahu, bú ebe Sọl nēdina, ya na Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya: ma Sọl nēdina n’ebe anēdebe ub͕ọ-ala, ndi Israel nānọ kwa n’ulo-ikwū buruburu ya.

6 Devid we za, si Ahimelek, bú onye Het, si kwa Abishai nwa Zeruaia, bú nwa-nne Joab, si, Ònye gēsorom ridakuru Sọl, rue ọmuma-ulo-ikwū? Abishai we si, Mu onwem gēsoro gi rida.

7 Devid na Abishai we biakute ndi Israel n’abali: ma, le, Sọl nēdina n’ura n’ebe anēdebe ub͕ọ-ala, atugide-kwa-ra ube-ya n’ala n’akuku isi-ya: Abnea na ndi Israel nēdina kwa ya buruburu.

8 Abishai we si Devid, Chineke emechibidowo onye-iro-gi nye n’aka-gi ta: ma ub͕u a, biko, ka m’were ube tugide ya n’ala otù ub͕ò, m’gaghi-atu kwa ya nke ub͕ò abua.

9 Devid we si Abishai, Ebibila ya: n’ihi na ònye ka ikpe nāmaghi n’iseti aka-ya megide onye Jehova etere manu?

10 Devid we si, Jehova nādi ndu, Jehova aghaghi itib͕u ya; ma-ọbu ubọchi-ya gābiaru, o we nwua; ma-ọbu na ọ gārida n’agha, ewe kpochapu ya.

11 Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú iseti akam megide onye Jehova etere manu: ma ub͕u a, biko, were ube di n’akuku isi-ya, na ite miri, ka ayi la.

12 Devid we were ube na ite miri site n’akuku isi Sọl; ha we la, ma ọ dighi onye nāhu ha, ọ dighi kwa onye mara, ọ dighi kwa onye nēteta: n’ihi na ha nile nāraru ura; n’ihi na oké ura nke Jehova dakwasiri ha.

13 Devid we gabiga n’ofè ọzọ, guzo n’elu ugwu n’ebe di anya; ebe-mbara n’etiti ha riri nne:

14 Devid we kpọ ndi Israel òkù, kpọ kwa Abnea nwa Nea, si, Ì zaghi, Abnea? Abnea we za, si, Ònye ka i bu nke nākpọ eze òkù?

15 Devid we si Abnea, Ọ̀ bughi nwoke ka i bu? ònye di kwa ka gi n’Israel? n’ìhi gini kwa ka i nēdebeghi onye-nwe-gi, bú eze, nke-ọma? n’ihi na otù onye nime ndi Israel batara ibibi eze, bú onye-nwe-gi.

16 Ọ dighi nma, bú ihe a nke i meworo. Jehova nādi ndu, ndi kwesiri ọnwu ka unu bu, n’ihi na unu edebeghi onye-nwe-unu nke-ọma, bú onye Jehova etere manu. Ma ub͕u a, le ebe ube eze di, na ite miri nke di n’akuku isi-ya.

17 Sọl we mata olu Devid, si, Ọ̀ bu olu-gi bú nka, nwam Devid? Devid we si, Ọ bu olum, onye-nwem, eze.

18 Ọ si kwa, N’ìhi gini kwa ka onye-nwem nāchu orù-ya n’azu? n’ihi na gini ka m’mere? ìhe ọjọ gini di kwa n’akam?

19 Ma ub͕u a, biko, ka onye-nwem, bú eze, nuru okwu nile nke orù-ya. Ọ buru na Jehova arafuwo gi imegidem, Ya nu ísì utọ nke onyinye-inata-iru-ọma: ma ọ buru umu madu, ndi anābu ọnu ka ha bu n’iru Jehova; n’ihi na ha achupuwom ta n’irapara n’aru ihe-nketa Jehova, si, Je, fè chi ọzọ òfùfè.

20 Ma ub͕u a, ka ọbaram ghara ida n’ala pua n’iru Jehova: n’ihi na eze Israel aputawo ichọ otù igwu, dika mb͕e madu nāchu ntá ọkwa n’ugwu.

21 Sọl we si, Emehiewom: lata, nwam Devid: n’ihi na m’gaghi-emejọ gi ọzọ, n’ihi na ndum di oké ọnu-ahia n’anya-gi ta: le, emewom ihe-nzuzu, me kwa ihe nke-uku ri nne n’amaghi-ama.

22 Devid we za, si, Le, ube-gi, eze! ka otù onye nime umu-okorọbia feta kwa, were ya.

23 Jehova gēnyeghachi kwa nwoke ọ bula ezi omume-ya na ikwesi-ntukwasi-obi-ya: ebe Jehova nyeworo gi n’akam ta, ma ekweghm iseti akam imegide onye Jehova etere manu.

24 Ma, le, dika ndu-gi di uku ta n’anyam, ka ndum di uku otú a n’anya Jehova, ka Ọ naputakwam na nkpab͕u nile.

25 Sọl we si Devid, Onye agọziri agọzi ka i bu, nwam Devid: i gēme kwa ihe nke-uku, nwe kwa ike nke-uku. Devid we je n’uzọ-ya, ma Sọl laghachiri n’ebe-ya.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 27

1 Devid we si obi-ya. Ub͕u a agēkpochapum otù ubọchi site n’aka Sọl: ọ dighi ihe dirim nma kari iwepugasi onwem ba n’ala ndi Filistia; Sọl agaghi-atukwasi kwa obi-ya n’arum, ichọm ọzọ n’ókè-ala nile nke Israel: m’gēwepuga kwa onwem n’aka-ya.

2 Devid we bilie, gabiga, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi nọ n’aka-ya, biakute Ekish nwa Maok, bú eze Gat.

3 Devid we biri n’aka Ekish na Gat, ya onwe-ya na ndikom-ya, nwoke ọ bula na ulo-ya, bú Devid na ndinyom-ya abua, Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwayi Kamel, bú nwunye Nebal.

4 Ewe gosi Sọl na Devid ab͕alagawo rue Gat: o we ghara ichọ ya ọzọ ma-ọli.

5 Devid we si Ekish, Biko, ọ buru na ahutawom amara n’iru-gi, ka ha nyem ebe n’otù obodo nime obodo ọhia, ka m’we biri n’ebe ahu: ma n’ìhi gini ka orù-gi gēbi n’obodo eze n’aka-gi?

6 Ekish we nye ya Ziklag n’ubọchi ahu: n’ihi ya ndi-eze Juda nwe Ziklag rue ta.

7 Ọnu-ọgugu ubọchi Devid biri n’ọhia ndi Filistia bu otù arọ zuru ezu na ọnwa anọ.

8 Devid na ndikom-ya we rigo, made imegide ndi Geshua, na ndi-Giazait, na ndi Amalek: n’ihi na ndi ahu bu ndi bi n’ala ahu, ndi sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ebe i nābà na Shua, we rue n’ala Ijipt.

9 Devid we tib͕ue ala ahu, o meghi kwa ka nwoke ma-ọbu nwayi di ndu, ma ọ chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na inyinya-ibu, na camel, na uwe, laghachi, biakute Ekish.

10 Ekish we si, Ònye ka unu madere megide ta? Devid we si, Megide Negeb nke Juda, megide kwa Negeb nke ndi Jerahmeel, megide kwa Negeb nke ndi-Kinait.

11 Ma Devid emeghi ka nwoke ma-ọbu nwayi di ndu, ime ka ha ba na Gat, ọ si, Ka ha we ghara igosi ihe bayere ayi, si, Otú a ka Devid mere, otú a ka ọ ganēme kwa ubọchi nile o nēbi n’ọhia ndi Filistia.

12 Ekish we kwere Devid, si, Ọ mewo onwe-ya ka o sì ísì ọjọ nke-uku n’etiti ndi-ya, bú Israel; ọ gābu-kwa-ram orù mb͕e ebighi-ebi.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 28

1 O rue, na mb͕e ahu, na ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha ibu agha, ibuso Israel agha. Ekish we si Devid, Mara nke-ọma na mu ka i gēso pua ba n’ọmuma-ulo-ikwū, gi onwe-gi na ndikom-i.

2 Devid we si Ekish, N’ihi ya gi onwe-gi gāmara ihe orù-gi gēme. Ekish we si Devid, N’ihi ya onye nēdebe isim ka m’gēdo gi ubọchi nile.

3 Ma Samuel anwuruwo, Israel nile we tiere ya aka n’obi, lì kwa ya na Rema, bú n’obodo-ya. Sọl ewezugawo kwa n’ala ndi nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa.

4 Ndi Filistia we chikọta onwe-ha, bia, ma ulo-ikwū-ha na Shunem: Sọl we chikọta Israel nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Gilboa.

5 Sọl we hu ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, o we tua egwu, obi-ya we ma jijiji nke-uku.

6 Sọl we jua Jehova ase, ma Jehova azaghi ya, Ọ zaghi na nrọ, ma-ọbu n’Ìhè, ma-ọbu n’ọnu ndi-amuma.

7 Sọl we si ndi-orù-ya, Chọrọnum nwayi nwere mọ ọ nāju ihe, ka m’we jekuru ya, jua ya ase. Ndi-orù-ya we si ya, Le, otù nwayi di n’En-doa nke nwere mọ ọ nāju ihe.

8 Sọl we nwogharia onwe-ya, yiri uwe ọzọ, je, ya onwe-ya na ndikom abua tiyere ya, ha we biakute nwayi ahu n’abali: ọ si, Biko, were mọ i nāju ihe juaram ase, me ka ọ rigokutem, bú onye ọ bula m’gāsi gi.

9 Nwayi ahu we si ya, Le, gi onwe-gi amawo ihe Sọl mere, na o bipuwo n’ala ndi nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: n’ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāb͕ara ndum ọnyà ime ka m’nwua?

10 Sọl we were Jehova ṅuara ya iyi, si, Jehova nādi ndu, Ahuhu ajọ omume agaghi-ezute gi ma-ọli n’ihe a.

11 Nwayi ahu we si, Ònye ka m’gēme ka ọ rigokute gi? Ọ si, Me ka Samuel rigokutem.

12 Nwayi ahu we hu Samuel, tie nkpu n’oké olu: nwayi ahu we gwa Sọl okwu, si, N’ìhi gini ka i ghọb͕uworom? n’ihi na gi onwe-gi bu Sọl.

13 Eze we si ya, Atula egwu: n’ihi na ọ̀ bu gini ka i huworo? Nwayi ahu we si Sọl, Ahuwom chi ka ha nēsi n’ala rigota.

14 Ọ si ya, Gini bu udi-aru-ya? Nwayi ahu we si, Agadi nwoke nārigota; eji kwa uwe-nwuda kpuchi nwoke ahu. Sọl we mata na Samuel ka ọ bu, ọ we rube isi-ya, da kpue iru-ya n’ala, kpọ isi ala.

15 Samuel we si Sọl, N’ìhi gini ka i nēkweghi ka m’nọdu ndu, ime ka m’rigota? Sọl we si, Anọm na nkpà nke-uku; ndi Filistia nēbusokwam agha, ma Chineke ewezugawo Onwe-ya n’arum, Ọ dighi-azakwam ọzọ, ma ọ bu n’aka ndi-amuma ma-ọbu na nrọ: m’we kpọ gi, ka i we me ka m’mara ihe m’gēme.

16 Samuel we si, N’ìhi gini kwa ka i nājum ajuju, ebe Jehova wezugaworo Onwe-ya n’aru gi, we ghọ onye-iro-gi?

17 Ma Jehova emeworo Onwe-ya, dika O kwuru site n’akam: Jehova adọwapuwo kwa ala-eze n’aka-gi, nye ya madu-ibe-gi, bú Devid.

18 N’ihi na i geghi nti olu Jehova, i meghi kwa ka idi-ọku nke iwe-Ya dakwasi Amalek, n’ihi ya ka Jehova meworo gi ihe a ta.

19 Ọzọ kwa, Jehova gēnye Israel n’aka ndi Filistia tiyere gi: echi ka gi na umu-gi ndikom gānọye-kwa-ram: Jehova gēnye kwa ọmuma-ulo-ikwū Israel n’aka ndi Filistia.

20 Sọl we da n’ala ngwa ngwa ka idi-elu-ya ra, o we tua egwu nke-uku, n’ihi okwu nile nke Samuel: ike adighi kwa nime ya; n’ihi na o righi nri n’ehihie ahu nile, na n’abali ahu nile.

21 Nwayi ahu we biakute Sọl, hu na aru mara ya jijiji nke-uku, ọ si ya, Le, nwanyi nējere gi ozi egewo nti olu-gi, m’we tiye ndum n’ọbu-akam, nu kwa okwu-gi nile nke i gwaram.

22 Ma ub͕u a, biko, gi onwe-gi ge kwa nti olu nwayi nējere gi ozi, ka m’dọba kwa iberibe achicha n’iru gi; gi ri kwa, ka ike we di nime gi, mb͕e i nēje n’uzọ-gi.

23 Ma ọ juru aju, si, M’gaghi-eri ihe. Ndi-orù-ya, na nwayi ahu kwa, we rugide ya; o we ge nti olu-ha. O we si n’ala bilie, nọkwasi n’ihe-ndina.

24 Ma nwayi ahu nwere n’ulo-ya nwa-ehi emere ka ọ ma abuba; o we me ngwa, b͕ue ya, were kwa utu ọka, gwọ ya, were ya sie achicha ekoghi-eko:

25 o we bute ya nso n’iru Sọl, na n’iru ndi-orù-ya; ha we rie. Ha we bilie, la n’abali ahu.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 29

1 Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha nile rue Efek: Israel nāma kwa ulo-ikwū-ha n’akuku isi-iyi nke di na Jezreel.

2 Ndi-isi ndi Filistia we nāgabiga ọgu ise, ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: Devid na ndikom-ya nāgabiga kwa n’azu, ha na Ekish.

3 Ndi-isi Filistia we si, Ndi-Hibru ndia, hà bu gini? Ekish we si ndi-isi ndi Filistia, Nkà abughi Devid, bú orù Sọl eze Israel, onye mu na ya nọworo ubọchi ndia ma-ọbu arọ ndia, ma ahutaghm n’aru ya ihe ọ bula di njọ site n’ubọchi ọ dapuru n’aka Sọl rue ta?

4 Ma ndi-isi ndi Filistia were iwe megide ya; ndi-isi ndi Filistia we si ya, Me ka nwoke a laghachi, ka o we laghachi n’ọnọdu-ya ebe i mere ka ọ buru onye-nlekọta-ya, ma ka ọ ghara iso ayi rida n’agha, ka o we ghara ighọrọ ayi onye-nmegide n’agha ahu: n’ihi na onye a gēji gini me ka ihe-ya tọ onye-nwe-ya utọ? ọ̀ gaghi-eji isi ndikom ndia?

5 Nkà abughi Devid, onye ha zaritara onwe-ha ihe bayere ya n’ite-egwú si,

Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri,

Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise?

6 Ekish we kpọ Devid, si ya, Jehova nādi ndu, n’ezie onye ziri ezi ka i bu: ọpupu-gi na nbata-gi n’ọmuma-ulo-ikwū n’akam di kwa nma n’anyam: n’ihi na ahutaghm ihe ọjọ n’aru gi site n’ubọchi i biakuterem rue ta: ma n’anya ndi-isi onye nādighi nma ka i bu.

7 Ma ub͕u a, laghachi, je kwa n’udo, ka i we ghara ime ihe ọjọ n’anya ndi-isi ndi Filistia.

8 Devid we si Ekish, Ma gini ka m’meworo? gini kwa ka i hutaworo n’aru orù-gi site n’ubọchi m’nọworo n’iru gi rue ta, na m’gaghi-abà buso ndi-iro onye-nwem, bú eze, agha?

9 Ekish we za, si Devid, Amawom na onye di nma n’anyam ka i bu, dika mọ-ozi Chineke: ọ bu nání na ndi-isi Filistia asiwo, Ọ gaghi-eso ayi rigo n’agha.

10 Ma ub͕u a bilie n’isi-ututu, gi na ndi-orù onye-nwe-gi ndi soro gi bia: mb͕e unu biliri n’isi-ututu, mb͕e ìhè diri unu, laghachi-kwa-nu.

11 Devid we bilie n’isi-ututu, ya onwe-ya na ndikom-ya, ila n’ututu, ilaghachi n’ala ndi Filistia. Ndi Filistia we rigo rue Jezreel.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 30

1 O rue, mb͕e Devid na ndikom-ya biaruru Ziklag n’ubọchi nke-atọ, na ndi Amalek amadewo na Negeb, made kwa na Ziklag, ha etib͕uwo kwa Ziklag, sure ya n’ọku,

2 dọta kwa ndinyom na ndi nile nọ na ya n’agha, site n’onye ntà we rue onye uku: ha emeghi ka onye ọ bula nwua, kama ha dupuru ha, je ije-ha.

3 Devid na ndikom-ya we ba n’obodo, ma, le, esurewo ya n’ọku; adọtawo kwa ndinyom-ha na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n’agha.

4 Devid na ndi ya na ha nọ we welie olu-ha kwa ákwá, rue mb͕e ike nādighi ha n’aru ọzọ ikwa ákwá.

5 Adọta-kwa-ra ndinyom abua nke Devid n’agha, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwunye Nebal onye Kamel.

6 Devid we nọ na nkpà nke-uku; n’ihi na ndi-ya siri ka ha were nkume tub͕ue ya, n’ihi na nkpuru-obi ndi-ya nile di ilu, nwoke ọ bula n’ihi umu-ya ndikom na n’ihi umu-ya ndinyom: ma Devid mere onwe-ya ka ọ di ike nime Jehova, bú Chineke-ya.

7 Devid we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, bú nwa Ahimelek, Biko, chitaram ephod nso. Abaiata we chita ephod ahu nso n’ebe Devid nọ.

8 Devid we jua Jehova ase, si, Ọ buru na achuam usu a ndi nāpunara madu ihe n’azu, #m’gēru ha aru? Ọ si ya, Chua: n’ihi na i ghaghi iru ha aru, i ghaghi kwa inaputa ha ihe nile.

9 Devid we je, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi soro ya, ọ biarue miri-iyi Besoa, ma ndi anārapu n’azu guzoro n’ebe ahu.

10 Ma Devid nāchu, ya onwe-ya na nnù ndikom: ma ọgu ndikom iri guzoro n’azu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi igabiga miri-iyi Besoa:

11 ha we huta onye Ijipt n’ọhia, kuru ya jekuru Devid, nye ya achicha, o rie; ha we me ka ọ ṅua miri:

12 ha we nye ya iberibe mbadamba fig, na uyọkọ abua nke nkpuru-vine amiri ami; o we rie, mọ-ya we laghachikute ya: n’ihi na o righi nri, ọ ṅughi kwa miri, ubọchi atọ ehihie na abali.

13 Devid we si ya, Ònye nwe gi? òle ebe i si bia kwa? Ọ si, Nwa-okorọbia Ijipt ka m’bu, m’buru kwa otù nwoke, bú onye Amalek, orù; onye-nwem we rapum, n’ihi na aru adighm ike ubọchi atọ gara aga.

14 Ayi onwe-ayi madere na Negeb nke ndi Keret, made kwa n’ala nke Juda nwere, made kwa na Negeb nke Keleb; ayi we sure Ziklag n’ọku.

15 Devid we si ya, Ì gēme ka m’ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe? Ọ si, Were Chineke ṅuaram iyi, na i gaghi-eme ka m’nwua, na i gaghi-emechibidokwam nye n’aka onye-nwem, m’gēme kwa ka i ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe.

16 O we me ka ọ rida, ma, le, ha ab͕asawo n’iru ala ahu nile, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ememe, n’ihi ihe-nkwata uku nile nke ha kwatara n’ala ndi Filistia, na n’ala Juda.

17 Devid we tib͕ue ha site n’ururuchi we rue anyasi echi-ya: ọ dighi kwa otù nwoke nime ha wepugara onwe-ya, ma-ọbughi nnù umu-okorọbia, ndi nọkwasiri na camel-ha, we b͕alaga.

18 Devid we naputa ihe nile Amalek chiri: Devid naputa-kwa-ra ndinyom-ya abua.

19 Ọ dighi kwa ihe fọduru ha iweghachi, ma ihe ntà ma ihe uku, ma umu-ndikom ma umu-ndinyom, ma ihe-nkwata ma ihe ọ bula ha were n’onwe-ha: Devid weghachiri ihe nile.

20 Devid we chiri ìgwè ewu na aturu nile na ìgwè ehi; ha dupuru ha n’iru anu-ulo ndia, si, Nka bu ihe-nkwata Devid.

21 Devid we biakute ọgu ndikom iri ahu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi ijeso Devid n’azu, ndi ha me-kwa-ra ka ha nọdu n’akuku miri-iyi Besoa: ha we puta izute Devid, na izute ndi ya na ha nọ: Devid we biarue nso ndi ahu, jua ha ajuju bayere udo-ha.

22 Ndikom ọjọ nile na ndi jọb͕uru onwe-ha, n’etiti ndi soro Devid je, we za, si, N’ihi na ha esoghi ayi je, ayi agaghi-enye kwa ha ihe ọ bula nime ihe-nkwata nke ayi naputara, ma-ọbughi inye nwoke ọ bula nwunye-ya na umu-ya, ka ha we duru ha, la.

23 Devid we si, Umu-nnem, ihe Jehova nyere ayi, bú Onye debere ayi, nye kwa n’aka-ayi usu ahu ndi nāpunara madu ihe, ndi biara imegide ayi, unu agaghi-ewere ihe ahu me otú a.

24 Ònye gēge kwa unu nti n’okwu a? n’ihi na dika òkè nke onye nārida n’agha si di, otú a ka òkè nke onye nānọdu n’akuku ihe-ayi di: ha gēkekọ n’otù.

25 O rue, site n’ubọchi ahu we ga n’iru, na o doro ya ibu ukpuru na ibu ikpé nye Israel, rue ta.

26 Devid we biarue Ziklag, zigara ndi-okenye Juda, bú ndi-eyì-ya, ufọdu nime ihe-nkwata, si, Le, ihe-ngọzi unu gēnwe sitere n’ihe-nkwata nke ndi-iro Jehova;

27 o zigara ndi nọ na Bet-el, ziga-kwa-ra ndi nọ na Remot nke Negeb, ziga-kwa-ra ndi nọ na Jatia;

28 ziga-kwa-ra ndi nọ n’Aroea, ziga-kwa-ra ndi nọ na Sifmot, ziga-kwa-ra ndi nọ n’Eshtemoa;

29 ziga-kwa-ra ndi nọ na Rakal, ziga-kwa-ra ndi nọ n’obodo nile nke ndi Jerahmeel, ziga-kwa-ra ndi nọ n’obodo nile nke ndi-Kinait;

30 ziga-kwa-ra ndi nọ na Họma, ziga-kwa-ra ndi nọ na Koa-ashan, ziga-kwa-ra ndi nọ n’Atak;

31 ziga-kwa-ra ndi nọ na Hebron, ziga kwa n’ebe nile ebe Devid onwe-ya na ndikom-ya nējeghari.