Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 1

1 Ma otù nwoke nke Ramataim-zofim, nke ugwu Efraim, di, aha-ya bu Elkena, nwa Jeroham, nwa Elaihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Efrata:

2 o nwekwara ndinyom abua; aha otù bu Hana, aha nke ibe-ya bu Penina: Penina nwere umu, ma Hana enweghi umu.

3 Nwoke a we si n’obodo-ya nārigo kwa-arọ ikpọ isi ala na ichuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha àjà n’ime Shailo. Ọ bu kwa n’ebe ahu ka umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, ndi-nchu-àjà Jehova, nọ.

4 Ubọchi ahu wee rue, Elkena we chua àjà, nye Penina nwunye-ya òkè ufọdu, nye kwa umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom nile:

5 ma o nyere Hana òkè madu abua: n’ihi na ọ bu Hana ka ọ huru n’anya, ma Jehova mechiri àkpà-nwa-ya.

6 Onye-nkpab͕u-ya we kpasue ya iwe nke-uku, imekpa ya aru, n’ihi na Jehova mechiri àkpà-nwa-ya.

7 Ọ bu kwa otú a ka Elkena nēme kwa-arọ, mb͕e ọ bula Hana rigoro n’ulo Jehova, otú a ka Penina nākpasu ya iwe; o we kwa ákwá, ghara iri ihe.

8 Elkena, bú di-ya, we si ya, Hana, n’ìhi gini ka i nākwa ákwá? ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka i nērighi ihe? ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka obi-gi jọrọ njọ? mù onwem adighi nma n’ebe i nọ kari umu-ndikom iri?

9 Hana we bilie mb͕e ha risiri ihe nime Shailo, mb͕e ha ṅusikwara ihe-ọṅuṅu. Ma Ilai, bú onye-nchu-àjà, nānọkwasi n’oche-ya n’akuku awara-uzọ ulo uku Jehova.

10 O we di Hana ilu na nkpuru-obi, o we kpere Jehova, kwasie ákwá ike.

11 Ọ we kwe nkwa, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ buru na I lekwasi anya n’ezie na nweda-n’ala nke orù-Gi nwayi, ọ buru na I chetam, ghara ichezọ orù-Gi nwayi, we nye orù-Gi nwayi nwa-nwoke, m’gēnye kwa ya Jehova ubọchi ndu-ya nile, aguba agaghi-aga kwa n’elu isi-ya.

12 O rue, mb͕e o kpere ọtutu ekpere n’iru Jehova, na Ilai nāriba ọnu-ya ama.

13 Ma Hana, ya onwe-ya nēkwu okwu n’obi-ya; nání egbugbere-ọnu-ya nēme úkpọ̀rọ́, ma anughi olu-ya: Ilai we chè na ọ ṅubigara manya ókè.

14 Ilai we si ya, Rùe ole mb͕e ka i ganāṅubiga manya ókè? wezuga manya-vine-gi n’aru gi.

15 Hana we za, si, É-è, onye-nwem, nwayi nke mọ-ya di arọ́ ka m’bu: ọ dighi manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n’anya m’ṅuworo, kama awusirim nkpuru-obim n’iru Jehova.

16 Agula orù-gi nwayi na nwayi jọb͕uru onwe-ya: n’ihi na ọ bu n’ọtutu ntughari-uchem na nkpasu-iwem ka m’siteworo kwue okwu rue ub͕u a.

17 Ilai we za, si, La n’udo: Chineke Israel nye kwa gi aririọ-gi nke i riọworo n’aka-Ya.

18 Hana we si, Ka nwayi nke nējere gi ozi huta amara n’iru gi. Nwayi ahu we je ije-ya, rie ihe, iru-ya ab͕arughi kwa n’ihi ya ọzọ.

19 Ha we bilie n’isi-ututu, kpọ isi ala n’iru Jehova, we lata, ba n’ulo-ha, rue Rema: Elkena we mara aru Hana nwunye-ya; Jehova we cheta ya.

20 O rue, n’ọb͕ub͕a arọ, na Hana turu ime, mua nwa-nwoke; o we kpọ aha-ya Samuel, si, N’ihi na ọ bu n’aka Jehova ka m’riọworo ya.

21 Nwoke ahu, bú Elkena, na ulo-ya nile we rigo ichuru Jehova aja arọ, na nkwa-ya.

22 Ma Hana arigoghi; n’ihi na ọ siri di-ya, rue mb͕e agēme ka nwata rapu ara, m’gēme kwa ka ọ bia, ka ewe hu ya anya n’iru Jehova, o we biri n’ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi.

23 Elkena, bú di-ya, we si ya, Me ihe di nma n’anya-gi; nọdu rue mb͕e i meworo ka ọ rapu ara; nání ka Jehova me ka okwu-Ya guzosie ike. Nwayi ahu we nọdu, nye nwa-ya ara, rue mb͕e o mere ka ọ rapu ara.

24 Ma mb͕e o mere ka ọ rapu ara, o we kuru ya n’aka-ya rigo, chiri kwa oke-ehi atọ, na otù ephah utu ọka, na otù karama-akpukpọ manya-vine, we me ka ọ ba n’ulo Jehova na Shailo: nwata ahu bu nání nwata.

25 Ha we b͕ue oke-ehi ahu, we me ka nwata ahu biakwute Ilai.

26 Hana we si, Biko, onyenwe m, nkpuru-obi-gi nādi ndu, onyenwe m, Mu onwem bu nwayi ahu nke guzoro onwe-ya nso gi n’ebe a, ikpere Jehova.

27 Ekpere bayere nwata nka ka m’kpere; Jehova we nyem aririọm nke m’riọrọ n’aka-Ya:

28 ọzọ kwa, mu onwem emewo ka ariọtara ya Jehova; ubọchi nile ọ nādi ndu ya onwe-ya bu onye ariọtaworo nye Jehova. Ilai we kpọ isi ala nye Jehova n’ebe ahu.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 2

1 Hana we kpe ekpere, si:

Ọ nātọ obi m utọ n’ime Jehova,

Mpim adiwo elu n’ime Jehova:

Ọnum asawo mbara n’elu ndi-irom,

N’ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi.

2 Ọ dighi onye di nsọ dika Jehova;

N’ihi na ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Gi:

Ọ dighi kwa oké nkume ọ bula dika Chineke-ayi.

3 Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu;

Ka oké okwu ghara isi n’ọnu-unu puta:

N’ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu,

Anēsite kwa n’aka-Ya atù omume.

4 Anyajiwo uta ndi-dike,

Ma ndi nāsu ngọngọ ewerewo ike ke onwe-ha dika ihe-ọkiké.

5 Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n’ihi nri;

Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu:

Ebe nwanyi àgà muworo umu asa;

Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru.

6 Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu:

Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota.

7 Jehova nānapu madu ihe, nēme kwa ka ọ buru ọgaranya:

Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu.

8 Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n’ájá bilie,

Ọ nēsi n’ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu,

Ime ka ha na ndi-isi nọdu,

Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru:

N’ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa,

O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n’elu ha.

9 Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe,

Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n’ọchichiri;

N’ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n’ike.

10 Agētipia ndi nāchọ Jehova okwu;

Ọ gāmakwasi ha éb͕è-elu-igwe n’elu-igwe:

Jehova gēkpe nsọtu nile nke uwa ikpe;

Ọ gēnye kwa eze-Ya ike,

Me kwa mpi onye-Ya etere manu ka ọ di elu.

11 Elkena we la Rema rue ulo-ya. Nwata ahu we nējere Jehova ozi n’iru Ilai, bú onye-nchu-àjà.

12 Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova.

13 Ikpe ekpere banyere ndi-nchu-àjà n’ebe ndi Israel nọ bu nka, mb͕e nwoke ọ bula nāchu àjà, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà we bata, mb͕e anēsi anu, nduri nke wara ezé atọ di n’aka-ya;

14 o we dubà ya n’ite ọku, ma-ọbu n’ite isi miri, ma-ọbu n’ite isi anu, ma-ọbu n’ite ọzọ; ihe ọ bula ndudu ahu dulitere ka onye-nchu-àjà nēwere na ya. Otú a ka ha nēme Israel nile n’ime Shailo, bú ndi nābia n’ebe ahu.

15 Ọzọ, tutu ha esure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà biara, si nwoke ahu nke nāchu àjà, Nye anu iruru onye-nchu-àjà; ọ gaghi-anara kwa anu esiri esi n’aka-gi, kama anu ndu.

16 Ma ọ buru na nwoke ahu asi ya, Ha aghaghi isure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ dika anēme ta, emesia nara n’onwe-gi dika nkpuru-obi-gi si achọ; ọ gāsi kwa, É-è, kama ub͕u a ka i gēnyem: ma ọ buru na i nyeghm, m’gānara ya n’ike.

17 Nmehie umu-okorọbia ahu we di ukwu ri nne n’iru Jehova: n’ihi na ndikom ahu nēleli-onyinye-inata-iru-ọma nke Jehova.

18 Ma Samuel nēje ozi n’iru Jehova, buru nwata, ewerewo kwa ephod nke ákwà ọcha ke ya dika ihe-ọkiké.

19 Nne-ya we mere ya uwe-nwuda ntà, chigoro ya kwa-arọ, mb͕e o soro di-ya rigo ichu àjà arọ.

20 Ilai we gọzie Elkena na nwunye-ya, si, Jehova doro gi nkpuru site na nwayi a n’ọnọdu ihe-nriọta ariọtara Jehova. Ha we la n’ebe-ha.

21 N’ihi na Jehova letara Hana, o we turu ime, mua umu-ndikom atọ na umu-ndinyom abua. Nwata ahu, bú Samuel, we nētó n’ulo Jehova.

22 Ma Ilai emewo agadi nke-uku; o we nu ihe nile umu-ya ndikom nēme Israel nile, na otú ha nēso ndinyom ahu dina, bú ndi nēzukọ n’usu n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

23 O we si ha, N’ìhi gini ka unu nēme ihe dika ihe ndia? n’ihi na mu onwem nānu ihe ọjọ nile unu n’ọnu ndi nka nile.

24 É-è, umum; n’ihi na ọ dighi nma, bú akukọ nke mu onwem nānu: unu nēme ka ndi Jehova jehie.

25 Ọ buru na madu emehie megide madu, Chineke gēkpe kwa ya ikpe: ma ọ buru na ọ bu Jehova ka madu nēmehie megide, ònye gēkpere Jehova ekpere bayere ya? Ma ha egeghi nti olu nna-ha, n’ihi na ọ tọrọ Jehova utọ ime ka ha nwua

26 Nwa-okoro ahu, bú Samuel, we nētó nāga n’iru, o we di nma, ma n’ebe Jehova nọ, ma n’ebe madu nọ.

27 Onye nke Chineke we biakwute Ilai, si ya, Otú a ka Jehova siri, Èkpugherem onwem n’ezie nye ulo nna-gi, mb͕e ha nọ n’Ijipt buru orù nye ulo Fero?

28 Èsim n’ebo nile nke Israel rọputa ya iburum onye-nchu-àjà, irigo rue ebe-ichu-àjàm, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, iyiri ephod n’irum? ènye-kwa-ram ulo nna-gi àjà-ọku nile nke umu Israel?

29 N’ìhi gini ka unu nāzọkwasi àjàm ukwu, zọkwasi kwa onyinye-inata-iru-ọmam, nke M’nyeworo n’iwu n’ebe-obibim; i we nāsọpuru umu-gi ndikom karim, ime onwe-unu ka unu ma abuba site n’ihe kachasi nma nke onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke Israel, bú ndim?

30 N’ihi nka, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta, Ọ bu ezie na M’siri na ulo-gi na ulo nna-gi gējeghari n’irum rue mb͕e ebighi-ebi: ma ub͕u a, ọ bu ihe si n’ọnu Jehova puta, Ya burum ihe-árú; n’ihi na ndi nāsọpurum ka M’gāsọpuru, ma agākpọ ha ihe efu, bú ndi nēlelìm.

31 Le, ubọchi nābia, na M’gēbipu ogwe-aka-gi na ogwe-aka ulo nna-gi, na agadi agaghi-adi n’ulo-gi.

32 I gēlegide kwa onye-nkpab͕u n’ebe-obibim, n’ezi ihe nile nke Chineke gēmere Israel: agadi agaghi-adi kwa n’ulo-gi ubọchi nile.

33 Ma nwoke nke diri gi, nke M’nāgaghi-ebipu n’ebe-ichu-àjàm, gābu ime ka anya-gi abua hubìe uzọ, na imekpa nkpuru-obi-gi aru: ọmùmù nile nke ulo-gi gānwu tutu ha erue agadi.

34 Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama, nke gābiakwasi umu-gi abua, bú Họfnai na Finehas; n’otù ubọchi ka ha abua gānwu.

35 Ma M’gēme ka onye-nchu-àjà nke kwesiri ntukwasi-obi bilierem, ọ bu dika ihe si di nke di nime obim na nime nkpuru-obim ka ọ gēme: M’gēwu-kwa-ra ya ulo kwesiri ntukwasi-obi, ọ gējeghari kwa n’iru onye nkem etere manu ubọchi nile.

36 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n’ulo-gi gābia ikpọ isi ala nye ya n’ihi ego ntà nke ọla-ọcha na ob͕e achicha, ọ gāsi kwa, Biko, tiyem n’otù uzọ ọlu-nchu-àjà, ka m’we rie iberibe achicha.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 3

1 Nwata ahu, bú Samuel, we nējere Jehova ozi n’iru Ilai. Okwu Jehova we di oké ọnu na mb͕e ahu; ọ dighi ọhù ekwusara.

2 O rue, n’ubọchi ahu, mb͕e Ilai nēdina ala n’ebe-ya, (ma anya-ya malitere ihu inyoghi-inyoghi, na ọ pughi ihu uzọ,)

3 mb͕e oriọna Chineke akānyughi anyu, mb͕e Samuel nēdina ala n’ulo ukwu Jehova, ebe ib͕e Chineke di;

4 na Jehova kpọrọ Samuel òkù: o we si, Lem.

5 O we b͕akuru Ilai, si, Lem; n’ihi na i kpọrọm òkù. Ọ si, Akpọghm òkù; jeghachi dina ala. O we je dina ala.

6 Jehova we kpọ kwa òkù ọzọ, si, Samuel. Samuel we bilie jekuru Ilai, si, Lem; n’ihi na i kpọrọm òkù. Ọ si, Akpọghm òkù, nwam; jeghachi dina ala.

7 Ma Samuel akāmaghi Jehova, akēkpugheghi kwa okwu Jehova nye ya.

8 Jehova we kpọ Samuel òkù ọzọ nke ub͕ò atọ. O we bilie, jekuru Ilai, si, Lem; n’ihi na i kpọrọm òkù. Ilai we ghọta na Jehova nākpọ nwa-okoro ahu òkù.

9 Ilai we si Samuel, Je, dina ala: ọ gēru kwa, ọ buru na Ọ kpọ gi òkù, na i gāsi, Kwue, Jehova; n’ihi na orù-Gi nānu. Samuel we je, dina ala n’ebe-ya.

10 Jehova we bia, guzo Onwe-ya, kpọ òkù dika Ọ kpọrọ ub͕ò nile, si, Samuel, Samuel. Samuel we si, Kwue; n’ihi na orù-Gi nānu.

11 Jehova we si Samuel, Le, Mu onwem nēme ihe n’Israel, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.

12 N’ubọchi ahu M’gēme ka okwu nile M’kwuworo banyere ulo-ya guzosie ike megide Ilai, site na nmalite we rue ọgwugwu.

13 Egosiwokwam ya na Mu onwem nēkpe ulo-ya ikpe rue mb͕e ebighi-ebi, n’ihi ajọ omume nke ọ mara, n’ihi na umu-ya ndikom nēwetara onwe-ha nkọcha, ma o b͕ochighi ha.

14 N’ihi ya M’we ṅuara ulo Ilai iyi, na agaghi-ewere àjà ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma kpuchie ajọ omume ulo Ilai rue mb͕e ebighi-ebi.

15 Samuel we dina ala rue ututu, we meghepu ọnu-uzọ ulo Jehova. Ma Samuel turu egwu igosi Ilai ọhù ahu.

16 Ilai we kpọ Samuel, si, Samuel, nwam. O we si, Lem.

17 Ọ si, Gini bu okwu ahu nke Ọ gwara gi? biko, ezonarilam ya: Chineke me gi otú a, me kwa gi ihe ọzọ otú a, ọ buru na i zonarim okwu ọ bula sitere n’okwu nile nke Ọ gwara gi.

18 Samuel we gosi ya okwu ahu nile, ọ dighi kwa ihe o zonariri ya. O we si, Jehova ka ọ bu: Ya me ihe di nma n’anya-Ya.

19 Samuel we tó, Jehova nọye-kwa-ra ya, Ọ kweghi kwa ka okwu da n’ala sitere n’okwu-ya nile.

20 Israel nile site na Dan we rue Bia-sheba we mara na emewo Samuel onye kwesiri okwukwe iburu Jehova onye-amuma.

21 Jehova we me ka ahú kwa ya anya ọzọ nime Shailo: n’ihi na Jehova kpughere Onwe-ya nye Samuel nime Shailo n’okwu Jehova.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 4

1 Okwu Samuel we rue Israel nile nti. Israel we pua izute ndi Filistia ibu agha, we ma ulo-ikwū-ha n’akuku Eben-eza: ndi Filistia we ma ulo-ikwū-ha n’Efek.

2 Ndi Filistia we do onwe-ha n’usoro izute Israel: agha ahu we nọsa, ewe tib͕ue Israel n’iru ndi Filistia: ha we tib͕ue n’etiti usoro ndi-agha Israel n’ọhia ihe ra ka nnù ndikom iri.

3 Ndi Israel we ba n’ọmuma-ulo-ikwū, ndi-okenye Israel we si, N’ìhi gini ka Jehova tib͕uworo ayi ta n’iru ndi Filistia? Ka ayi si na Shailo wetara onwe-ayi ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ka o we bata n’etiti ayi, zọputa ayi n’ọbu-aka ndi-iro-ayi.

4 Ndi Israel we ziga na Shailo, ha we si n’ebe ahu bute ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye bi n’etiti cherubim: umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nọye-kwa-ra ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke n’ebe ahu.

5 O rue, mb͕e ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova batara n’ọmuma-ulo-ikwū, na Israel nile tiri oké nkpu, ala wee daa uda.

6 Ndi Filistia we nu olu iti-nkpu ahu, we si, Gini bu olu oké iti-nkpu a n’ọmuma-ulo-ikwū ndi-Hibru? Ha we mara na ib͕e Jehova abàwo n’ọmuma-ulo-ikwū.

7 Ndi Filistia we tua egwu, n’ihi na ha siri, Chineke abàwo n’ọmuma-ulo-ikwū ahu. Ha we si, Ahuhu nādiri ayi! n’ihi na ihe dika nka adighi na mb͕e gara aga.

8 Ahuhu nādiri ayi! ònye gānaputa ayi n’aka chi ndia di ike nke-ukwu? ndia bu chi nke were ihe-otiti nile ọ bula tib͕ue ndi Ijipt n’ọzara.

9 Menu onwe-unu ka unu di ike, buru-kwa-nu ndikom, unu ndi Filistia, ka unu ghara iburu ndi-Hibru ndi-orù, dika ha buruworo unu ndi-orù: burunu ndikom, bu-kwa-nu agha.

10 Ndi Filistia we bu agha, ewe tib͕ue Israel, ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n’ulo-ikwū-ya: oké ntib͕u uku we di; orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise, bú ndi ji ukwu eje, we dapu n’Israel.

11 Ewe were ib͕e Chineke; umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nwukwara.

12 Otù nwoke onye Benjamin we si n’usoro agha ahu b͕a ọsọ, biarue Shailo n’ubọchi ahu, uwe nwuda ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi ya n’isi.

13 Ọ we bia, ma, le, Ilai nānọkwasi n’oche-ya n’akuku uzọ, nēche nche: n’ihi na obi-ya nāma jijiji n’ihi ib͕e Chineke. Nwoke ahu we ba igosi ya n’obodo, obodo ahu nile we tie nkpu.

14 Ilai we nu olu iti-nkpu ahu, si, Gini bu olu ùzù a? Nwoke ahu we me ngwa bata, gosi Ilai.

15 Ma Ilai b͕ara ọgu arọ anọ na iri na asatọ; anya-ya abua guzoro eguzo, ọ pughi kwa ihu uzọ.

16 Nwoke ahu we si Ilai, Mu onwem bu onye si n’usoro agha bia, mu onwem si kwa n’usoro agha b͕alaga ta. O we si, Gini bu ihe emere, nwam?

17 Onye ahu nke nēzì ozi ahu we za, si, Israel ab͕alagawo n’iru ndi Filistia, ọzọ kwa, oké ntib͕u adiwo n’etiti ndi Israel, ọzọ kwa, umu-gi ndikom abua, bú Họfnai na Finehas, anwuwo, ewerewo kwa ib͕e Chineke.

18 O rue, mb͕e o hotara ib͕e Chineke, na o si n’oche-ya dala azu n’akuku ọnu-uzọ-ama, olu-ya we b͕ajie, o we nwua: n’ihi na nwoke ahu bu agadi, di kwa arọ́. Ya onwe-ya kpe-kwa-ra Israel ikpe ọgu arọ abua.

19 Nwunye nwa-ya, bú nwunye Finehas, di ime, ọ gaje imu nwa: o we nu akukọ ahu na ewerewo ib͕e Chineke, na nna di-ya na di-ya anwuwo, o we ruru ala mua nwa; n’ihi na ime mere ya na mberede.

20 Ma na mb͕e ọnwu-ya ndinyom ndi nēguzo n’akuku ya we kwue, si, Atula egwu; n’ihi na nwoke ka i muworo. Ma ọ zaghi, ọ tukwasighi kwa obi-ya na ya.

21 O we kpọ aha nwa ahu Ikabod, si, Nsọpuru esiwo n’Israel pua: n’ihi owuwe ewere ib͕e Chineke, na n’ihi nna di-ya na di-ya.

22 O we si, Nsọpuru esiwo n’Israel pua; n’ihi na ewerewo ib͕e Chineke.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 5

1 Ma ndi Filistia were ib͕e Chineke, ha we si n’Eben-eza bubata ya n’Ashdod.

2 Ndi Filistia we were ib͕e Chineke, bubata ya n’ulo Degon, dọba ya n’akuku Degon.

3 Ndi Ashdod we bilie n’isi-ututu n’echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n’ala n’iru ib͕e Jehova. Ha we were Degon, tiyeghachi ya n’ọnọdu-ya.

4 Ha we bilie n’isi-ututu n’echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n’ala n’iru ib͕e Jehova; ma ebipuwo isi Degon na ọbu-aka-ya abua, ha we tọb͕ọrọ na nbata-uzọ; nání akuku-ya nke bu azù fọduru ya.

5 N’ihi ya ndi-nchu-aja Degon na ndi nile nke nābà n’ulo Degon adighi-azọkwasi ukwu na nbata-uzọ Degon n’Ashdod, rue ta.

6 Aka Jehova we di arọ́ n’aru ndi Ashdod, Ọ we kpochapu ha, were kwa emerod tib͕ue ha, bú Ashdod na ókè-ala-ya nile.

7 Ndikom Ashdod we hu na ọ di otú a, ha we si, Ib͕e Chineke Israel agaghi-anọgide n’etiti ayi: n’ihi na aka-Ya esikawo ike n’aru ayi na n’aru Degon, bú chi-ayi.

8 Ha we ziga, chikọtara onwe-ha ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Chineke Israel? Ha we si, Ka eburu ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu rue Gat. Ha we būru ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu rue ebe ahu.

9 O rue, mb͕e ha būsiri ya buruburu, na aka Jehova digidere obodo ahu n’ọb͕ub͕a-aghara di uku ri nne: Ọ we tib͕ue ndikom obodo ahu, site n’onye ntà we rue onye uku, emerod we b͕apue n’aru ha.

10 Ha we ziga ib͕e Chineke rue Ekron. O rue, mb͕e ib͕e Chineke biaruru Ekron, na ndi Ekron tiri nkpu, si, Ha eburuwo ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu biakute ayi, ime ka ayi na ndi-ayi nwua.

11 Ha we ziga, chikọta ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Zilaga ib͕e Chineke Israel, ka ọ laghachi kwa n’ebe-ya, ka o we ghara ime ka ayi na ndi-ayi nwua: n’ihi na ọb͕ub͕a-aghara nke ọnwu di n’obodo ahu nile; ọ di arọ́ nke-uku, bú aka Chineke, n’ebe ahu.

12 Ndikom kwa ndi nānwughi, ewere emerod tib͕ue ha: ntiku obodo ahu we rigorue elu-igwe.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 6

1 Ib͕e Jehova we di n’ọhia ndi Filistia ọnwa asa.

2 Ndi Filistia we kpọ ndi-nchu-aja na ndi nāju ase, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Jehova? me ka ayi mara ihe ayi gēji zilaga ya n’ebe-ya.

3 Ha we si, Ọ buru na unu ezilaga ib͕e Chineke Israel, ezilagala ya n’aka efu; kama unu aghaghi inyeghachi Ya àjà-ikpe-ọmuma: mb͕e ahu agēme ka aru-unu di ike, agēme kwa ka unu mara ihe mere anēwezugaghi aka-Ya n’aru unu.

4 Ha we si, Gini gābu àjà-ikpe-ọmuma ahu nke ayi gēnyeghachi Ya? Ha we si, Dika ọnu-ọgugu ndi-isi ndi Filistia si di, ọ bu emerod ọla-edo ise na òké ọla-edo ise ka unu gēnyeghachi: n’ihi na otù ihe-otiti diri ha nile, di-kwa-ra ndi-isi-unu.

5 Unu gēme kwa onyinyo emerod-unu, na onyinyo òké-unu nke nēbibi ala-unu; unu gēnye kwa Chineke Israel nsọpuru: eleghi anya Ọ gēme ka aka-Ya di nfé pua n’aru unu, na n’aru chi nile unu, na n’ala-unu.

6 N’ìhi gini kwa ka unu nēme ka obi-unu di arọ́, dika ndi Ijipt na Fero mere ka obi-ha di arọ́? mb͕e Ọ kwara ha emò, hà ezilagaghi ha, ha we la?

7 Ma ub͕u a, werenu ihe me otù ub͕ọ-ala ọhu, chiri kwa nne-ehi abua nke nēnye umu ara, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ha, kegide-kwa-nu ehi ahu n’ub͕ọ-ala, me ka umu-ha si n’iso ha n’azu lata n’ulo:

8 were-kwa-nu ib͕e Jehova tiyekwasi ya n’ub͕ọ-ala ahu; tiye ihe ọla-edo ahu, nke unu nēnyeghachi Ya ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, n’ib͕e ntà n’akuku-ya; zilaga-kwa-nu ya, ka ọ we la.

9 Le-kwa-nu, ọ buru na ọ rigo n’uzọ ókè-ala-ya rue Bet-shemesh, Ya onwe-ya emewo ayi oké ihe ọjọ a: ma ọ buru na ọ rigoghi otú a, ayi gāma kwa na ọ bughi aka-Ya tib͕uru ayi; ihe-ndabà ka ihe ahu bu, nke dabara ayi.

10 Ndikom ahu we me otú a; ha chiri nne-ehi abua nke nēnye umu ara, kegide ha n’ub͕ọ-ala ahu, mechibido umu-ha uzọ n’ulo:

11 ha we tukwasi ib͕e Jehova n’ub͕ọ-ala ahu, na ib͕e ntà ahu, na òké ọla-edo, na onyinyo emerod-ha.

12 Ehi ahu we jezie ejezi n’uzọ rue uzọ Bet-shemesh: ọ bu n’otù uzọ atuliri atuli ka ha jere, nēje nēti nkpu, ha ewezugaghi kwa onwe-ha n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe; ndi-isi ndi Filistia we nējeso ha n’uzọ rue ókè-ala Bet-shemesh.

13 Ma ndi Bet-shemesh nēbì ọka wheat-ha na ndagwurugwu: ha we welie anya-ha, hu ib͕e ahu, ṅuria ọṅu ihu ya.

14 Ub͕ọ-ala ahu we ba n’ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, guzo n’ebe ahu, nkume uku di kwa n’ebe ahu: ha we kpọwa osisi ub͕ọ-ala ahu, sure ehi abua ahu ọku ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.

15 Ndi Livai we buda ib͕e Jehova na ib͕e ntà nke di n’akuku ya, nke ihe ọla-edo ahu nile di nime ya, ha we tukwasi ha na nkume uku ahu: ndikom Bet-shemesh we sure àjà-nsure-ọku, chu-kwa-ra Jehova aja ọzọ, n’ubọchi ahu.

16 Ndi-isi ise nke ndi Filistia we hu ya, laghachi rue Ekron n’ubọchi ahu.

17 Ndia bu emerod ọla-edo nke ndi Filistia nyeghachiri, ibu àjà-ikpe-ọmuma ichuru Jehova; Ashdod nwere otù, Geza nwere otù, Ashkelon nwere otù, Gat nwere otù, Ekron nwere otù;

18 òké ọla-edo kwa, dika ọnu-ọgugu obodo nile nke ndi Filistia si di, bú nke ndi-isi ise ahu nwere, site n’obodo ewusiri ike we rue obodo ntà nke nēnweghi mb͕idi: we rue nkume uku ahu, bú Ebel, nke ha dọbara ib͕e Jehova n’elu ya: ọ di n’ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, rue ta.

19 O we tib͕ue ufọdu nime ndikom Bet-shemesh, n’ihi na ha lere anya nime ib͕e Jehova, O we tib͕ue n’etiti ndi Israel ọgu ndikom atọ na iri, orú nnù ndikom uzọ isi na nnù ise: ndi Israel we rue újú, n’ihi na Jehova tib͕uru ntib͕u uku n’etiti ndi Israel.

20 Ndikom Bet-shemesh we si, Ònye puru iguzo n’iru Jehova, bú Chineke nsọ a? Ọ̀ bu kwa onye ka O gēsi n’ebe ayi nọ rigokuru?

21 Ha we zigara ndi bi na Kiriat-jearim ndi-ozi, si, Ndi Filistia ebughachiwo ib͕e Jehova; ridatanu, bugo ya n’ebe unu nọ.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 7

1 Ndikom Kiriat-jearim we bia, bugo ib͕e Jehova, bubata ya n’ulo Abinadab n’ugwu ntà ya, do Eleeza nwa-ya nwoke nsọ idebe ib͕e Jehova.

2 O rue, site n’ubọchi ib͕e ahu nọduru na Kiriat-jearim, na ubọchi bara uba; o we di orú arọ: ulo Israel nile we kwaso Jehova.

3 Samuel we gwa ulo Israel nile okwu, si, Ọ buru na obi-unu nile ka unu onwe-unu nēwere laghachikute Jehova, wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ na Ashtarot n’etiti unu, dozie obi-unu ibiakute Jehova, fè-kwa-nu nání Ya òfùfè: Ọ gānaputa kwa unu n’aka ndi Filistia.

4 Umu Israel we wezuga Bealim na Ashtarot, fè nání Jehova òfùfè.

5 Samuel we si, Chikọtanu Israel nile rue Mizpa, m’gēkpe-kwa-ra Jehova ekpere bayere unu.

6 Ha we chikọta onwe-ha rue Mizpa, sere miri, wusi ya n’iru Jehova, bue ọnu n’ubọchi ahu, kwue n’ebe ahu, si, Ayi emehiewo megide Jehova. Samuel we kpe umu Israel ikpe na Mizpa.

7 Ndi Filistia we nu na umu Israel chikọtara onwe-ha na Mizpa, ndi-isi ndi Filistia we rigo imegide Israel. Umu Israel we nu ya, tua egwu ndi Filistia.

8 Umu Israel we si Samuel, Ab͕ala nkiti bayere ayi n’itiku Jehova, bú Chineke-ayi, nkpu, ka O we zọputa ayi n’aka ndi Filistia.

9 Samuel we were otù nwa-aturu nke nāṅu ara, o we sure ya ọku ka ọ buru àjà-nsuresi-ọku anēsurere Jehova: Samuel we tikue Jehova nkpu bayere Israel; Jehova we za ya.

10 O rue, mb͕e Samuel nēsure àjà-nsure-ọku ahu, na ndi Filistia biaruru nso ibuso Israel agha: Jehova we were oké olu makwasi ndi Filistia éb͕è-elu-igwe n’ubọchi ahu, we me ka ha b͕a aghara; ewe tib͕ue ha n’iru Israel.

11 Ndikom Israel we si na Mizpa puta, chua ndi Filistia, tib͕ue ha rue okpuru Bet-ka.

12 Samuel we were otù nkume do ya n’etiti Mizpa na Shen, kpọ aha-ya Eben-eza, si, Jehova eyerewo ayi aka rue ub͕u a.

13 Ewe me ka ndi Filistia ruru ala, ha abàghi ọzọ n’ókè-ala Israel: aka Jehova we digide ndi Filistia ubọchi nile nke Samuel.

14 Ewe nyeghachi Israel obodo nile nke ndi Filistia nara Israel, site n’Ekron we rue Gat; ókè-ala-ha ka Israel naputara n’aka ndi Filistia. Ma udo di n’etiti Israel na ndi-Amorait.

15 Samuel we kpe Israel ikpe ubọchi nile nke ndu-ya.

16 O we nēje buruburu kwa-arọ rue Bet-el, na Gilgal, na Mizpa; o we kpe Israel ikpe n’ebe ahu nile.

17 Nlata-ya bu na Rema, n’ihi na n’ebe ahu ka ulo-ya di; ọ bu kwa n’ebe ahu ka ọ kpere Israel ikpe: o we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n’ebe ahu.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 8

1 O rue, mb͕e Samuel ghọrọ agadi, na o doro umu-ya ndikom ndi-ikpe ikpe Israel.

2 Ma aha ọkpara-ya bu Joel; aha nwa-ya nwoke nke-abua bu Abaija: ha bu ndi-ikpe nime Bia-sheba.

3 Ma umu-ya ndikom ejeghi kwa ije n’uzọ-ya nile, ha we wezuga onwe-ha soro urù nēzighi ezi, ha we nara ihe-iri-ngo, wezuga ikpé.

4 Ndi-okenye nile nke Israel we chikọta onwe-ha, biakute Samuel rue Rema:

5 ha we si ya, Le, gi onwe-gi aghọwo agadi, ma umu-gi ndikom adighi-eje ije n’uzọ-gi nile: ub͕u a mere ayi eze ikpe ayi ikpe dika mba nile.

6 Ma okwu ahu jọrọ njọ n’anya Samuel, mb͕e ha siri, Nye ayi eze ikpe ayi ikpe. Samuel we kpere Jehova.

7 Jehova we si Samuel, Ge nti olu ndim n’ihe nile ha nāsi gi: n’ihi na ọ bughi gi ka ha juworo, kama ọ bu Mu ka ha juworo, ka M’ghara iburu ha eze.

8 Dika omume nile si di nke ha meworo site n’ubọchi M’mere ka ha si n’Ijipt rigota we rue ta, ha we rapum, fè chi ọzọ òfùfè, otú a ka ha onwe-ha nēme kwa gi.

9 Ma ub͕u a ge nti olu-ha: nání na i gāb͕asiri ha àmà ike, gosi kwa ha ikpé eze ahu nke gābu eze-ha.

10 Samuel we gwa ndi Israel, ndi nāriọ eze n’aka-ya, okwu nile nke Jehova.

11 O we si, Nka gābu ikpé eze ahu nke gābu eze-unu: umu-unu ndikom ka ọ gāchiri, doro ha onwe-ya n’ub͕ọ-ala-ya na n’elu inyinya-ya; ha gānab͕a kwa ọsọ n’iru ub͕ọ-ala-ya:

12 o gēdo-kwa-ra ha onwe-ya ibu ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom abua na iri; na ilu ọlu-ubi-ya, na iwe ihe-ubi-ya, na ikpu ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke ub͕ọ-ala-ya.

13 Ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ọ gāchiri ibu ndi nāsugwa ude nēsì ísì utọ, na ibu ndi-odozi-anu, na ibu ndi-osi-ite.

14 Ubi-unu, na ubi-vine-unu, na ubi-olive-unu, bú nke kachasi nma, ka ọ gēwere kwa, nye ndi-orù-ya.

15 Nkpuru-ọghigha-unu na ubi-vine-unu ka ọ gēwere otù uzọ n’uzọ iri, nye ndi nējere ya ozi, nye kwa ndi-orù-ya.

16 Ọ bu kwa ndi-orù-unu ndikom, na ndinyom nējere unu ozi, na umu-okorọbia-unu, bú ndi kachasi nma, na inyinya-ibu-unu, ka ọ gēwere, me ka ha je ozi-ya.

17 Ìgwè ewu na aturu-unu ka ọ gēwere kwa otù uzọ n’uzọ iri: unu onwe-unu gābu-kwa-ra ya orù.

18 Unu gēti kwa nkpu n’ubọchi ahu n’ihi eze-unu nke unu rọputara onwe-unu; ma Jehova agaghi-aza unu n’ubọchi ahu.

19 Ma ndi Israel juru ige nti olu Samuel; ha si, É-è; kama, eze gāchiri ayi;

20 ka ayi we di, ọbuná ayi onwe-ayi, ka mba nile; ka eze-ayi we nēkpe kwa ayi ikpe, nāpu kwa je n’iru ayi, nēbu kwa agha-ayi.

21 Samuel we nu okwu nile nke ndi Israel, o we kwue ha na nti Jehova.

22 Jehova we si Samuel, Ge nti olu-ha, mere ha eze. Samuel we si ndikom Israel, Lanu, nwoke ọ bula n’obodo-ya.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 9

1 Ma otù nwoke Benjamin di, aha-ya bu Kish, nwa Abiel, nwa Zeroa, nwa Bekorat, nwa Afia, nwa onye Benjamin, bú dike nke bu dìnkpà.

2 Ọ nwe-kwa-ra nwa-nwoke, aha-ya bu Sọl, ọ bu nwa-okorọbia, ọ ma-kwa-ra nma: ọ dighi kwa nwoke n’etiti umu Israel mara nma kari ya: site n’ubu-ya we rue elu isi-ya ka ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel.

3 Ma nne-inyinya-ibu nile nke Kish, bú nna Sọl, nwere furu efu. Kish we si Sọl nwa-ya, Biko, kuru otù nime ndi-orù tiyere onwe-gi, bilie, je, chọ nne-inyinya-ibum.

4 O we gabiga n’ugwu Efraim, gabiga kwa n’ala Shalisha, ma ha achọtaghi ha: ha we gabiga n’ala Shaalim, ma ha adighi n’ebe ahu: o we gabiga n’ala Benjamin, ma ha achọtaghi ha.

5 Mb͕e ndi ahu batara n’ala Zuf, Sọl siri nwa-okorọbia-ya nke soro ya je, Bia, ka ayi laghachi; ka nnam we ghara igha iche uche bayere nne-inyinya-ibu-ya, we cheb͕u onwe-ya bayere ayi.

6 O we si ya, Biko, le, onye nke Chineke nọ n’obodo a, anāsọpuru kwa nwoke ahu; ihe nile ọ nēkwu aghaghi irè erè: ub͕u a ka ayi je n’ebe ahu; eleghi anya ọ gēgosi ayi uzọ-ayi nke ayi jeworo na ya.

7 Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Ma, le, ọ buru na ayi eje, gini ka ayi gēji bakuru nwoke ahu? n’ihi na achicha alapuwo n’ihe-ayi, ọ dighi kwa onyinye iji bakuru onye nke Chineke: gini di n’aka-ayi?

8 Nwa-okorọbia ahu we za Sọl ọzọ, si, Le, achọtawo n’akam otù uzọ n’uzọ anọ nke shekel ọla-ọcha: m’gēnye kwa ya onye nke Chineke, ka o we gosi ayi uzọ-ayi.

9 (Na mb͕e gara aga n’Israel, otú a ka otu nwoke siri mb͕e o jere iju Chineke ase, Bianu, ka ayi jekuru onye-ọhu-uzọ: n’ihi na onye anākpọ Onye-amuma ta, anākpọ ya Onye-ọhu-uzọ na mb͕e gara aga).

10 Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Okwu-gi di nma; bia, ka ayi je. Ha we je n’obodo ebe onye nke Chineke nọ.

11 Ka ndi ahu nārigo na nrigo obodo ahu, ha onwe-ha hutara umu-ab͕ọghọ ka ha nāputa isere miri, ha we si ha, Onye-ọhu-uzọ, ọ̀ nọ n’ebe a?

12 Ha we za ha, si, Ọ nọ, le, ọ nọ n’iru gi: me ngwa ub͕u a, n’ihi na ta ka ọ batara n’obodo; n’ihi na ndi Israel nwere àjà ta n’ebe di elu a:

13 mb͕e unu bara n’obodo, otú a ka unu gāchọta ya, tutu ọ rigorue ebe di elu iri ihe: n’ihi na ndi Israel agaghi-eri ihe rue mb͕e ọ biara, n’ihi na ya onwe-ya nāgọzi àjà-ha; emesia ndi akpọworo gēri ihe. Ma ub͕u a rigonu; n’ihi na ya onwe-ya, ub͕u a ka unu gāchọta ya.

14 Ha we rigorue obodo; ka ndi ahu nābà n’etiti obodo, le, Samuel nāputa izute ha, irigoru ebe di elu ahu.

15 Ma Jehova kpughepuru nti Samuel ka ọ nu ihe otù ubọchi tutu Sọl abia, si,

16 Dika mb͕e a echi M’gēzitere gi otù nwoke sitere n’ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n’aka ndi Filistia: n’ihi na ahuwom ndim, n’ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti.

17 Mb͕e Samuel huru Sọl, Jehova we za ya, si, Le nwoke ahu onye M’siri gi te manu! onye a gēb͕ochi ndim n’ime ihe ọjọ.

18 Sọl we biarue Samuel nso n’etiti ọnu-uzọ-ama, si, Biko, gosim ebe ọ di, bú ulo onye-ọhu-uzọ.

19 Samuel we za Sọl, si, Mu onwem bu onye-ọhu-uzọ ahu; rigorue ebe di elu n’irum, unu gēsokwam ri ihe ta: m’gēzilaga kwa gi n’ututu, ihe nile nke di n’obi-gi ka m’gēgosi kwa gi.

20 Ma nne-inyinya-ibu-gi nke funariri gi, ta bu ubọchi atọ, atukwasila obi-gi na ha; n’ihi na achọtawo ha. Ma ònye nwere ihe nile anāchọsi ike nke Israel? ọ bughi gi na ulo nile nke nna-gi?

21 Sọl we za, si, Ọ̀ bughi onye Benjamin ka m’bu, sitere n’ebo Israel nke dikarisiri ntà? ab͕urum, ọ̀ pekarisighi npe n’etiti ab͕uru nile nke ebo Benjamin? n’ìhi gini kwa ka i gwaworom okwu dika okwu a si di?

22 Samuel we kuru Sọl na nwa-okorọbia-ya, me ka ha ba n’ime-ulo, o we nye ha isi ọnọdu n’etití ndi akpọrọ n’oriri ahu, ndi ahu ra ka orú madu na iri.

23 Samuel we si odozi-anu, Weta òkè nke m’nyere gi, nke m’siri gi, Dọba ya n’ebe i nọ.

24 Odozi-anu ahu we bulie utaku-ukwu ahu na ihe di n’elu ya, dọba ya n’iru Sọl. Samuel we si, Le ihe fọduru! dọba ya n’iru gi, rie; n’ihi na rue mb͕e akara àkà ka edebeworo gi nka, si, Akpọwom ndi Israel. Sọl we soro Samuel rie ihe ubọchi ahu.

25 Ha we si n’ebe di elu ahu rida n’obodo, o we kpayere Sọl uka n’elu-ulo.

26 Ha we bilie n’isi-ututu: o we rue, mb͕e chi bọrọ, na Samuel kpọrọ Sọl n’elu-ulo, si, Bilie, ka m’we zilaga gi. Sọl we bilie, ha abua we pua, ya onwe-ya na Samuel, rue èzí.

27 Ka ha onwe-ha nārida na nsọtu obodo, Samuel we si Sọl, Si nwa-okorọbia-gi gabiga n’iru ayi, (ọ we gabiga,) ma gi onwe-gi guzogide ub͕u a, ka m’we me ka i nu okwu Chineke.

Categories
I. SAMUEL

I. SAMUEL 10

1 Samuel we were karama manu, wukwasi ya n’isi-ya, sutu ya ọnu, si, Ọ̀ bughi na Jehova etewo gi manu ibu onye-ndú ihe-nketa-Ya?

2 Mb͕e i siri n’ebe m’nọ la ta, i gāhuta kwa ndikom abua n’akuku ílì Rechel n’ókè-ala Benjamin na Zelza; ha gāsi kwa gi, Achọtawo nne-inyinya-ibu nke i jere ichọ: ma, le, nna-gi arapuwo okwu nne-inyinya-ibu-ya, ọ nēcheb͕u kwa onwe-ya bayere unu, si, Gini ka m’gēme ichọta nwam?

3 I gēsi kwa n’ebe ahu gabiga n’iru, bia rue osisi terebinth nke Teboa, ma ndikom atọ ndi nārigokuru Chineke rue Bet-el gāhuta gi n’ebe ahu, otù onye nēbu umu-ewu atọ, otù onye nēbu ob͕e achicha atọ, otù onye nēbu kwa karama-akpukpọ manya-vine:

4 ha gāju kwa gi ajuju bayere udo-gi, we nye gi ob͕e achicha abua; i gānara kwa ha n’aka-ha.

5 Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n’ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n’ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n’iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:

6 Mọ nke Jehova gādakwasi gi n’ike, i gēsoro kwa ha bū amuma, i gāb͕anwe kwa ghọ nwoke ọzọ.

7 O gēru kwa, mb͕e ihe-iriba-ama ndia biaruru gi aru, gi mere onwe-gi dika aka-gi si chọta; n’ihi na Chineke nọyere gi.

8 I gēbukwam uzọ rida rue Gilgal; ma, le, mu onwem nāridakute gi, isure àjà-nsure-ọku, na ichu ihe àjà nke àjà-udo: ubọchi asa ka i ganēche, rue mb͕e m’gābiakute gi, me ka i mara ihe i gēme.

9 O rue, mb͕e o chighariri azu-ya isi n’ebe Samuel nọ la, na Chineke b͕anwere ya obi ọzọ: ihe-iriba-ama ndia nile we rè n’ubọchi ahu.

10 Ha we biarue ebe ahu, rue ugwu ntà ahu, ma, le, usu ndi-amuma zutere ya; Mọ nke Chineke we dakwasi ya n’ike, o we bū amuma n’etiti ha.

11 O rue, mb͕e ndi nile ndi mara ya na mb͕e gara aga huru, ma, le, ọ nēso ndi-amuma bū amuma, ndi ahu we sirita onwe-ha, Gini bu nka nke mere nwa Kish? Sọl, ọ̀ di kwa n’etiti ndi-amuma?

12 Otù nwoke nke sitere n’ebe ahu we za, si, Ònye bu kwa nna-ha? N’ihi ya ọ ghọrọ ilu, bú okwu a, Sọl, ọ̀ di kwa n’etiti ndi-amuma?

13 O we bubìe amuma, bia rue ebe di elu ahu.

14 Nwa-nne nna Sọl we si ya na nwa-okorọbia-ya, Òle ebe unu jere? Ọ si, Ichọ nne-inyinya-ibu-ayi: ayi we hu na ọ dighi ebe ọ bula ha di, ayi we biakute Samuel.

15 Nwa-nne nna Sọl we si, Biko, gosim ihe Samuel siri unu.

16 Sọl we si nwa-nne nna-ya, O gosiri ayi nke-ọma na achọtawo nne-inyinya-ibu. Ma o gosighi ya okwu ala-eze ahu nke Samuel kwuru.

17 Samuel we kpọkọta ndi Israel ibiakute Jehova rue Mizpa;

18 o we si umu Israel, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka Israel si n’Ijipt rigota, M’we naputa unu n’aka ndi Ijipt na n’aka ala-eze nile nke nēmeb͕u unu:

19 ma unu onwe-unu ajuwo Chineke-unu ta, Onye Ya onwe-ya nāzọputa unu n’aka ihe ọjọ unu nile na nkpab͕u nile unu; unu we si Ya, É-è, kama mere ayi eze. Ma ub͕u a guzonu onwe-unu n’iru Jehova n’ebo nile unu, na n’usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri unu.

20 Samuel we me ka ebo Israel nile biarue nso, nzà we ma ebo Benjamin.

21 O we me ka ebo Benjamin biarue nso n’ab͕uru nile ha, nzà we ma ab͕uru Matri: nzà we ma Sọl nwa Kish: ha we chọ ya, ma achọtaghi ya.

22 Ha we ju kwa Jehova ase ọzọ, si, Ọ̀ kābiaghi ebe a, bú nwoke ahu? Jehova we si, Le, onye ahu ezowo onwe-ya n’etiti ihe.

23 Ha we b͕a ọsọ, si n’ebe ahu kuru ya; o we guzo onwe-ya n’etiti ndi Israel, ma ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel site n’ubu-ya we rue elu isi-ya.

24 Samuel we si ndi Israel nile, Ùnu ahuwo onye ahu nke Jehova rọputaworo, na ọ dighi onye di ka ya n’etiti ndi Israel nile? Ndi Israel nile we tie nkpu, si, Ka eze-ayi di ndu.

25 Samuel we gwa ndi Israel ikpe ala-eze ahu, de kwa ya n’akwukwọ, dọba ya n’iru Jehova. Samuel we zilaga ndi Israel nile, nwoke ọ bula n’ulo-ya.

26 Sọl we la kwa n’ulo-ya rue Gibea; ndi bu dìnkpà, ndi Chineke meturu obi-ha aka, we jeso ya.

27 Ma ufọdu ndi jọb͕uru onwe-ha siri, Onye a, ò gēsi aṅa zọputa ayi? Ha we lelia ya, ha ewetaghi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma. O we di ka onye nti chiri.