Categories
I. PITA

I. PITA 1

1 Pita, onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi arọputaworo ndi bi dika ọbìa n’etiti Nb͕asa ahu nime Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia,

2 ndi arọputaworo dika ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara si di, nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ, ka unu we ṅa Jisus Kraist nti, ka ewe fesa kwa unu ọbara-Ya: Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo.

3 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye muru ayi ọzọ, dika oké ebere-Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya di ndu, site na nbilite ahu nke Jisus Kraist si na ndi mwuru anwu bilite,

4 ka ayi we keta nketa nke anāpughi imebi, nke anādighi-emeru kwa emeru, nke nādighi-atalata kwa, nke edebeworo n’elu-igwe nye unu,

5 ndi ewere ike nke Chineke nēche nche site n’okwukwe rue nzọputa nke edoziworo ikpughe n’oge ikpe-azu.

6 Nke obi nātọ unu utọ nke-uku nime ya, ọ bu ezie na emere ka o wuta unu n’ọnwunwa di iche iche nwa oge ub͕u a, ma asi na ọ di nkpà,

7 ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n’iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist:

8 Onye unu huru n’anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n’ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto:

9 ebe unu nānata ihe okwukwe-unu gēweta, bú nzọputa nke nkpuru-obi-unu.

10 Ọ bu kwa nzọputa nka ka ndi-amuma chọrọ, nyocha kwa ihe bayere ya, bú ndi buru amuma bayere amara ahu nke gēru unu:

11 nēnyocha oge ọ bu ma-ọbu aha oge ọ bu, bú nke Mọ nke Kraist Nke si nime ha nēgosi, mb͕e O buru uzọ nāb͕a àmà bayere ahuhu nke Kraist, na ebube nile nke gēso ha.

12 Ndi ekpughere nye, na ọ bughi onwe-ha, kama ọ bu unu, ka ha ji ihe ndia jere ozi, bú ihe nke akọrọ unu ub͕u a site n’ọnu ndi ahu ndi zìri unu ozi ọma nka nime Mọ Nsọ eziputara n’elu-igwe; ihe ọ nāgu ndi-mọ-ozi inyocha ha.

13 N’ihi nka kenu ihe-ọkiké a n’úkwù nke uche-unu, nwe-kwa-nu anya-udo, lezu-kwa-nu anya okè n’amara nke anēwetara unu nime nkpughe nke Jisus Kraist;

14 dika umu nke iṅa-nti, unu eme-kwa-la onwe-unu ka unu di ka agu ihe ọjọ ahu si di, bú nke guru unu na mbu n’amaghi-ihe-unu:

15 kama dika Onye kpọrọ unu di nsọ, unu onwe-unu, ghọ-kwa-nu ndi di nsọ n’ibi-obi nile di iche iche;

16 n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Unu gādi nsọ; n’ihi na nsọ ka Mu onwem di.

17 Ọ buru kwa na unu akpọku Ya dika Nna, bú Onye nēkpe ikpé dika ọlu madu nile n’otù n’otù si di nēleghi madu anya n’iru, nēbinu obi n’egwu n’oge unu bi dika ọbìa:

18 ebe unu matara na ejighi ihe apuru imebi, bú ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo, b͕aputa unu n’ibi-obi efu unu nke nna-unu-hà nyere unu n’aka ibi;

19 kama eji ọbara di oké ọnu-ahia, dika nke nwa-aturu nke ọlu ma-ọbu ntupọ nādighi ya n’aru, bú ọbara nke Kraist:

20 Onye eburu uzọ mara n’ezie mb͕e akātọghi ntọ-ala nke uwa, ma emere ka Ọ puta ìhè n’ọgwugwu oge ndia n’ihi unu,

21 ndi sitere n’aka-Ya buru ndi kwere na Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, we nye Ya ebube; ka okwukwe-unu na olile-anya-unu we di n’ebe Chineke nọ.

22 Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n’iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n’anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n’anya, sitenu n’obi-unu hurita onwe-unu n’anya si-ike:

23 ebe amuworo unu ọzọ, esiteghi na nkpuru apuru imebi, kama esitere na nke anāpughi imebi, site n’okwu Chineke, nke di ndu, nke nādigide kwa, mu unu ọzọ.

24 N’ihi na,

Anu-aru nile di ka ahihia,

Ebube-ya nile di kwa ka uzari ahihia.

Ahihia akpọnwuwo, uzari-ya adapuwo kwa:

25 Ma okwu Onye-nwe-ayi nādigide rue mb͕e ebighi-ebi.

Nka bu kwa okwu nke ozi ọma ahu ezisara unu.

Categories
I. PITA

I. PITA 2

1 Ya mere, tupunu ihe ọjọ nile, na aghughọ nile, na iru-abua, na ekworo, na nkwutọ nile di iche iche,

2 dika umu amuru ọhu, ka agu miri-ara nke okwu Chineke, nke aghughọ nādighi ya, nāgusi unu ike, ka unu we were ya nētó etó rue nzọputa;

3 ọ buru na unu deturu n’ire na Onye-nwe-ayi bu onye nwere obi-ọma;

4 Onye unu nābiakute, bú nkume di ndu, Nke madu juru n’ezie, ma n’ebe Chineke nọ Ọ bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru,

5 ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.

6 N’ihi na ekwuru n’ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, si,

Le, anamatọb͕ọ na Zaion otù isi nkume nime nkuku ntọ-ala, nke bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru:

Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya ma-ọli.

7 Ya mere ọ bu unu, bú ndi kwere ekwe, ka nsọpuru ahu diri: ma n’ebe ndi nādighi-ekwe nọ,

Nkume nke ndi nēwu ulo juru,

Nke ahu ka emere isi nkuku ulo;

8 na,

Nkume isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n’ọnyà;

n’ihi na ha nāsu ngọngọ n’okwu ahu, ebe ha nēkweyeghi ekweye: edo-kwa-ra ha ka ha me ihe a.

9 Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n’ọchichiri ahu ba n’ìhè-Ya di ebube:

10 ndi nābughi ndi n’oge gara aga, ma ub͕u a unu bu ndi nke Chineke: ndi anēmereghri ebere, ma ub͕u a unu bu ndi emeworo ebere.

11 Ndi m’huru n’anya, ariọm unu dika ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa, ka unu ghara ime ihe ọjọ di iche iche nāgu anu-aru, nke bu ihe nēbu agha imegide nkpuru-obi;

12 nēbinu obi-unu nke-ọma n’etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n’ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n’ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.

13 Donu onwe-unu n’okpuru ibu-isi ọ bula madu debere n’ihi Onye-nwe-ayi; ma ọ bu eze, dika onye nọ n’ike n’elu unu;

14 ma-ọbu ndi-isi, dika ndi anēzite site n’aka-ya ka ha bọ̀ ọ́bọ̀ n’aru ndi nēme ihe ọjọ, ka ha to kwa ndi nēme ezi ihe.

15 N’ihi na otú a ka ọchichọ nke Chineke si di, ka unu site n’ime ezi ihe me ka amaghi-ihe nke ndi nēnweghi uche kpuchie ọnu:

16 dika ndi nwere onwe-ha, ma unu enweghi inwe-onwe-unu ahu dika ihe-nkpuchi nke ihe ọjọ, kama dika ndi-orù nke Chineke.

17 Sọpurunu madu nile. Hunu òtù ndi bu umu-nna n’anya. Nātunu egwu Chineke. Nāsọpurunu eze-unu.

18 Ndi nēje ozi, nēdonu onwe-unu n’okpuru ndi-nwe-unu n’egwu nile; ọ bughi nání n’okpuru ndi bu ezi madu ndi nwe-kwa-ra obi-ọma, kama ọ bu kwa n’okpuru ndi b͕agọrọ ab͕agọ.

19 N’ihi na nka bu ihe-ekele, ma ọ buru na onye ọ bula nātachi obi n’ihe-nwuta di iche iche n’ihi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ, nāhu ahuhu nke nēzighi ezi.

20 N’ihi na àha otuto gini di ya, ma ọ buru na, mb͕e unu nēmehie, mb͕e eti kwa unu aka, unu atachi obi na ya?

21 N’ihi na akpọrọ unu ime nka: n’ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n’ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile:

22 Onye ọ dighi nmehie ọ bula O mere, ahughi kwa aghughọ n’ọnu-Ya:

23 Onye, mb͕e anēkwuto Ya, Ọ dighi-ekwutọghachi ọzọ; mb͕e Ọ nāhu ahuhu, Ọ dighi-aba nba; kama Ọ rara Onwe-ya nye n’aka Onye ahu Nke nēkpe ikpé ziri ezi:

24 Onye Ya onwe-ya, dika àjà achuru, būru nmehie nile ayi n’aru-Ya n’elu osisi ahu, ka ayi, ebe ayi nwuworo n’ebe nmehie nile di, ka ayi we di ndu n’ebe ezi omume di; Onye eji ọnyá-utari-Ya me ka unu nwe ezi ndu.

25 N’ihi na unu nēhieri dika aturu; ma ub͕u a unu chigharikutere Onye ahu Onye nāzù nkpuru-obi-unu dika anāzù aturu, Onye nēlekọta kwa ha anya.

Categories
I. PITA

I. PITA 3

1 Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n’okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n’ibi-obi nwunye-ha rita ha n’urù n’ebe anēkwughi okwu;

2 mb͕e ha nēle ibi-obi-unu di ọcha, ya na egwu.

3 Ndi ichọ-nma-ha ka ọ ghara ibu ichọ-nma ahu nke aru nke bu ikpa isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, ma-ọbu iyikwasi ọtutu uwe;

4 kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n’uwe anāpughi imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n’anya Chineke.

5 N’ihi na otú a ka ndinyom ahu ndi di nsọ, ndi nēle anya Chineke, nāchọ kwa onwe-ha nma n’oge gara aga, nēdo onwe-ha n’okpuru di nke aka ha:

6 dika Sera ṅara Abraham nti, nākpọ ya onye-nwe-ya: onye emere unu ka unu buru umu-ya, ma ọ buru na unu eme ezi ihe, ghara kwa itu egwu site n’ujọ ọ bula.

7 Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n’uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.

8 Ma n’ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n’anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala:

9 ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n’ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n’ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n’ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.

10 N’ihi na,

Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n’anya,

Na ihu ezi ubọchi,

Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ,

Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ:

11 Ya si kwa n’ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe;

Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.

12 N’ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n’aru ndi ezi omume,

Nti-Ya abua di kwa n’ebe aririọ-ha di:

Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ.

13 Ọ̀nye bu kwa onye ahu nke gēmejọ unu, ma o buru na unu ghọro ndi nānu ọku n’obi n’iso ezi ihe?

14 Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n’ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri;

15 kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu:

16 ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya.

17 N’ihi na ọ ka nma, ma ọ buru na ọchichọ Chineke chọrọ ya, ka unu hu ahuhu n’ihi na unu nēme ezi ihe kama n’ihi na unu nēme ihe ọjọ.

18 N’ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu bayere nmehie, nání otù mb͕e, Onye ezi omume n’ihi ndi ajọ omume, ka O we kuru ayi biakute Chineke; n’ihi na emere ka Ọ nwua anwu n’anu-aru-Ya, ma emere ka Ọ di ndu na mọ-Ya;

19 nke ọ bu kwa nime ya ka Ọ gara we kwusara ndi-mọ nọ n’ulọ-nkpọrọ okwu,

20 ndi nēkweyeghi n’oge gara aga, mb͕e ogologo-ntachi-obi Chineke nēchesi ike n’ubọchi Noa, mb͕e anēdozi ub͕o, nke ewere miri zọputa madu ole-na-ole, ya bu madu asatọ, nime ya:

21 bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n’uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ, site na nbilite-n’ọnwu nke Jisus Kraist;

22 Onye nọ n’aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n’elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n’okpuru Ya.

Categories
I. PITA

I. PITA 4

1 Ya mere, ebe Kraist huru ahuhu n’anu-aru, unu onwe-unu were kwa otù izù ahu ke dika ekike-agha; n’ihi na onye huworo ahuhu n’anu-aru agharawo nmehie;

2 ka unu we ghara ibi ọzọ n’oge fọduru unu n’anu-aru-unu ime ihe ọjọ di iche iche nāgu madu, kama ime ihe Chineke nāchọ.

3 N’ihi na oge nke gasiworo ezuwo iluputa ihe ndi mba ọzọ nēzube, na ijeghari nime agu ikwa-iko, agu ihe ọjọ nile, manya-ob͕ub͕u nile, ite-egwú nile, iṅubiga-manya-ókè nile, na ikpere-arusi nile jọb͕uru onwe-ha:

4 nke ha nēchè na ọ bu ihe madu nāhughi mb͕e ọ bula na unu adighi-eso ha n’omume ahu b͕abà n’otù njubiga-ókè ahu nke ndu ila-n’iyì, ha nēkwulu unu:

5 ndi gāza ajuju bayere onwe-ha nye Onye ahu Nke doziworo Onwe-ya ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpé.

6 N’ihi na ihe eji zìsara ọbuná ndi nwuru anwu ozi ọma bu nka, ka ewe kpe ha ikpé dika esi ekpe madu n’anu-aru, ma ka ha we di ndu dika Chineke si di na mọ.

7 Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere:

8 nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n’anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n’ihi na ihu-n’anya nēkpuchi ọtutu nmehie:

9 nelērita onwe-unu ọbìa nke-ọma nātamughi ntamu:

10 dika unu nile n’otù n’otù natara onyinye-amara, werenu ihe ahu nējerita onwe-unu ozi, dika ndi nāchi èzi-na-ulo nke-ọma n’amara Chineke nke di n’uzọ di iche iche;

11 ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n’ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n’ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n’ihe nile site n’aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

12 Ndi m’huru n’anya, unu echèla èchichè bayere ọnwunwa ọku ahu nke di n’etiti unu, nke nābiakwasi unu inwa unu, na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula, dika agāsi na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula nādakwasi unu:

13 kama ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāṅurinu ọṅu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ṅuria nime nkpughe nke ebube-Ya.

14 Ọ buru na anāta unu uta n’aha Kraist, ngọzi nādiri unu; n’ihi na Mọ nke ebube na Mọ nke Chineke nānọgide n’aru unu.

15 N’ihi na, ka onye ọ bula n’etiti unu ghara ihu ahuhu dika ob͕u-madu, ma-ọbu onye-ori, ma-ọbu onye nēme ihe ọjọ, ma-ọbu dika onye nēle ihe nābughi nke aka ya anya:

16 ma ọ buru na onye ọ bula nāhu ahuhu dika Kristian, ka ihere ghara ime ya; ma ka o nye Chineke otuto n’aha nka.

17 N’ihi na oge ahu eruwo ka esite n’ulo Chineke malite ikpe ikpé: ma ọ buru na o buru uzọ site n’aru ayi malite, gini gābu ọgwugwu nke ndi nēkweyeghi ozi ọma nke Chineke?

18 Ọ buru kwa na ọ di ike izọputa onye ezi omume, òle ebe agēgosi onye nādighi-asọpuru Chineke na onye-nmhie?

19 Ya mere ka ndi nāhu ahuhu dika ọchichọ Chineke si di were kwa nkpuru-obi-ha n’ime ezi ihe nye n’aka Onye-òkìkè kwesiri ntukwasi-obi idebe.

Categories
I. PITA

I. PITA 5

1 Ya mere, ariọm ndi-okenye nọ n’etiti unu, onye mu onwem bu okenye-ibe-unu, ya na onye-àmà nke ahuhu nile nke Kraist, abukwam onye-nnwekọ nke ebube ahu nke agaje ikpughe:

2 Nāzùnu ìgwè aturu ntà Chineke nke di n’etiti unu, nēlekọta ha anya, ọ bughi n’ihi na nkpà nākpa unu, kama site n’ọchichọ obi, dika Chineke chọrọ; ọ bughi kwa n’ihi urù nēweta ihere, kama n’ihi na unu di ọku n’obi;

3 ọ bughi kwa dika agāsi na unu nēme ndi bu ihe-nketa dika unu bu ndi-nwe-ha, kama nēme onwe-unu ihe-atù ìgwè aturu ntà ahu gēṅomi.

4 Mb͕e agēme kwa ka Onye-isi-ọzùzù-aturu puta ìhè, unu gānata okpu-eze nke ebube ahu, nke nādighi-atalata.

5 Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n’okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n’ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n’obi amara.

6 Ya mere wedanu onwe-unu n’okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n’oge nke Ya;

7 nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n’ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n’obi.

8 Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:

9 ma nēguzogidenu ya, n’ihi na unu di ike n’okwukwe-unu, ebe unu matara na anēmezu otù ahuhu ahu n’aru ndi bu òtù umu-nna-unu ndi nọ n’uwa.

10 Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n’ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.

11 Ọ bu Ya nwe ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

12 Site n’aka Silvanọs, nwa-nna-ayi kwesiri ntukwasi-obi, dika m’nāgu ya, ka m’nēdegara unu akwukwọ n’okwu ole-na-ole, nāriọ unu, nāb͕a kwa àmà na nka bu amara Chineke n’ezie: nēguzosinu ike nime ya.

13 Nwanyi ahu nke nọ na Babilon, nke soro unu buru onye arọputaworo, nēkele unu; nwam, bú Mak, nēkele kwa unu.

14 Werenu isutu-ọnu nke ihu-n’anya nēkelerita onwe-unu.

Udo diri unu nile ndi nọ nime Kraist.