Categories
I. NDI TESALỌNAIKA

I. NDI TESALỌNAIKA 1

1 Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo.

2 Ayi nēkele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu nile, nēcheta unu mb͕e ayi nēkpe ekpere;

3 ebe ayi nēcheta nēwepughi aka ọlu nke okwukwe unu na ndọb͕u-n’ọlu nke ihunanya unu na ntachi-obi nke olile-anya unu ji ele anya Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, n’iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi;

4 ebe ayi matara, umu-nna-ayi ndi Chineke huru n’anya, i rọputa unu,

5 na ọ bughi nání n’okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n’ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n’ebe unu nọ n’ihi unu.

6 Unu onwe-unu ghọchikwara ndi nēṅomi ayi na Onye-nwe-ayi, ebe unu were ọṅù nke Mọ Nsọ nara okwu ahu nke-ọma nime ọtutu nkpab͕u;

7 ya mere unu ghọrọ ihe-atù n’ebe ha nile, nọ, bú ndi kwere ekwe nime Masedọnia na nime Akaia.

8 N’ihi na okwu nke Onye-nwe-ayi esiwo n’aru-unu daputa udà, ọ bughi nání na Masedọnia na Akaia, kama n’ebe nile ọ bula okwukwe-unu n’ebe Chineke nọ aputawo ìhè; ya mere ọ dighi ayi nkpà ikwu okwu ọ bula.

9 N’ihi na ha onwe-ha nākọ akukọ bayere ayi aha nbata ayi batara n’ebe unu nọ; ya na otú unu siri n’arusi chigharikute Chineke, ibu orù Chineke Nke di ndu Nke bu kwa onye-ezi-okwu,

10 na ichere Ọkpara-Ya Onye gēsi n’elu-igwe bia, Onye O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, bú Jisus, Onye nādọputa ayi n’iwe nke nābia.

Categories
I. NDI TESALỌNAIKA

I. NDI TESALỌNAIKA 2

1 N’ihi na unu onwe-unu matara, umu-nna-ayi, nbata ayi batara n’ebe unu nọ, na ahuwo na ọ bughi ihe-efu:

2 kama ọ bu ezie na ayi hururi ahuhu na mbu, eme kwa ayi ihe-ihere, dika unu matara, na Filipai, ma ayi kwuwara okwu nime Chineke-ayi igwa unu ozi ọma Chineke n’oké nb͕a.

3 N’ihi na aririọ ayi nāriọ unu esighi na njehie puta, o sighi kwa n’adighi-ọcha, ọ bughi kwa n’aghughọ:

4 kama dika Chineke nwaputaworo ayi ka enye ozi ọma Ya n’aka-ayi na ntukwasi-obi idebe, otú a ka ayi nēkwu; ọ bughi dika ndi nēme ihe gātọ madu utọ, kama dika ndi nēme ihe gātọ Chineke utọ, bú Onye nānwa obi-ayi.

5 N’ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ahuru ayi n’ikwu okwu nrafu, dika unu matara, ma-ọbu n’iwere aghughọ b͕achita anya-uku, Chineke bu onye-àmà;

6 ma-ọbu n’ichọ otuto site na madu, ma-ọbu n’aka-unu, ma-ọbu n’aka ndi ọzọ, mb͕e ayi puru idi ka ibu arọ́, dika ndi-ozi Kraist.

7 Kama ayi ghọrọ ndi di nwayọ n’etiti unu, dika mb͕e nwanyi nke nāzù nwa nēlezi umu nke aka ya anya nke-ọma:

8 otú a, ebe unu di ayi n’obi nke-uku, ọ diri ayi ezi nma ime ka unu keta, ọ bughi nání ozi ọma nke Chineke, kama ọ bu kwa nkpuru-obi nke aka ayi, n’ihi na emere ka unu buru ndi ayi huru n’anya.

9 N’ihi na unu nēcheta, umu-nna-ayi, ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n’ọlu na ihuju-anya-ayi: n’ihi na ayi nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu, ayi we kwusara unu ozi ọma nke Chineke.

10 Unu onwe-unu bu ndi-àmà, Chineke bu kwa onye-àmà, otú ahuru ayi na ayi bu ndi di ọcha n’obi na ndi ezi omume na ndi nādighi ita uta n’ebe unu nọ, bú ndi kwere ekwe:

11 ọbuná dika unu matara otú ayi mere madu nile ọ bula nime unu, dika nna si emere umu nke aka ya, nāriọ unu, nākasi kwa unu obi, nāgwasi kwa unu okwu ike,

12 ka unu we nējeghari dika ọ kwesiri Chineke, Onye nākpọbata unu n’ala-eze na ebube nke aka Ya.

13 Ọ bu kwa n’ihi nka ka ayi onwe-ayi nēkele kwa Chineke nēwepughi aka, na, mb͕e unu natara okwu nke unu nuru n’ọnu-ayi, bú okwu nke Chineke, ọ bughi okwu madu ka unu nara nke-ọma, kama, otú ọ di n’ezi-okwu, ọ bu okwu Chineke, nke nālusi kwa ọlu ike nime unu ndi kwere ekwe.

14 N’ihi na unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ghọrọ ndi nēṅomi nzukọ nile nke Chineke nke di na Judia nime Kraist Jisus: n’ihi na unu onwe-unu hu-kwa-ra otù ahuhu ahu n’aka ndi unu na ha bu otù ala, ọbuná dika ndi ahu huru ahuhu n’aka ndi-Ju;

15 ndi b͕uru Onye-nwe-ayi Jisus na ndi-amuma, chupu kwa ayi, ha bu kwa ndi ihe ha nēme nātọghi Chineke utọ, ha nēmegide kwa madu nile;

16 Na-eb͕ochi ayi igwa ndi mba ọzọ okwu ka ewe zọputa ha; imezu nmehie nile ha mb͕e nile: ma iwe Chineke abiakwasiwo ha rue ọgwugwu-ha.

17 Ma ayi onwe-ayi, umu-nna-ayi, ebe ekewapuru ayi n’aru-unu nwa oge ntà, n’iru, ọ bughi n’obi, ayi were oké agu nubiga ọku ókè n’obi kari ihu iru-unu:

18 n’ihi na ayi chọrọ ibiakute unu, mu onwem, bú Pọl, otù mb͕e na mb͕e ọzọ; Setan b͕ochikwara ayi.

19 N’ihi na gini bu olile-anya-ayi, ma-ọbu ọṅù-ayi, ma-ọbu okpu-eze nke inya-isi ayi? Ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu, n’iru Onye-nwe-ayi Jisus n’ọbibia-Ya?

20 N’ihi na unu onwe-unu bu otuto-ayi na ọṅù-ayi.

Categories
I. NDI TESALỌNAIKA

I. NDI TESALỌNAIKA 3

1 N’ihi nka mb͕e ayi nāpughi inagide ọzọ, ọ di ayi ezi nma ka arapu nání ayi n’azu n’Atens;

2 ayi we ziga Timọti, nwa-nna-ayi na onye nējere Chineke ozi n’ozi ọma nke Kraist, ka o we me ka unu guzosie ike, ka o we kasi kwa unu obi n’ihi okwukwe-unu;

3 ka ewe ghara ikwaghari onye ọ bula nime nkpab͕u ndia; n’ihi na unu onwe-unu matara na ọ bu n’ihi nka ka edoro ayi.

4 N’ihi na n’ezie, mb͕e ayi nọ n’etiti unu, ayi buru uzọ nāgwa unu na agaje ikpab͕u ayi; ọbuná dika o mere, dika unu matakwara.

5 N’ihi nka mu onwem kwa, mb͕e m’nāpughi idi nānagide ya ọzọ, eziterem ka m’mara okwukwe-unu, ma o nwere uzọ ọ bula onye-ọnwunwa ahu nwarari unu, ndọb͕u ayi dọb͕uru onwe-ayi n’ọlu we ghọ ihe-efu.

6 Ma mb͕e Timọti siri n’ebe unu nọ biakute ayi ọbuná ub͕u a, we zìe ayi ozi ọma bayere okwukwe na ihunanya unu, si kwa na unu nēcheta ayi ezi ncheta mb͕e nile, na agu ihu ayi anya nāgusi kwa unu ike, ọbuná dika ọ nāgu kwa ayi onwe-ayi ihu unu;

7 n’ihi nka, umu-nna-ayi, akasiri ayi obi n’ihi unu nime nkpà-ayi nile na nkpab͕u-ayi nile site n’okwukwe-unu:

8 n’ihi na ayi di ndu ub͕u a, ọ buru na unu onwe-unu nēguzosi ike nime Onye-nwe-ayi.

9 N’ihi na ekele gini ka ayi puru inyeghachi Chineke bayere unu, n’ọṅù nile ayi ji ṅuria n’ihi unu n’iru Chineke-ayi;

10 abali na ehihie nāriọbiga aririọ ókè nke-uku ri nne ka ayi we hu iru-unu, dochi kwa ihe fọduru n’okwukwe-unu?

11 Ma ka Ya onwe-ya, bú Chineke-ayi na Nna-ayi, Onye-nwe-ayi Jisus, duzi uzọ-ayi rue ebe unu nọ:

12 ka Onye-nwe-ayi me kwa ka unu rie nne babiga kwa ókè n’ihunanya n’ebe ibe-unu nọ, na n’ebe madu nile nọ, ọbuná dika ayi onwe-ayi di n’ebe unu nọ;

13 ka O we me ka obi-unu guzosie ike nādighi ita uta n’idi-nsọ n’iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, n’ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus, Ya na ndi nsọ Ya nile.

Categories
I. NDI TESALỌNAIKA

I. NDI TESALỌNAIKA 4

1 Ya mere nke fọduru, umu-nna-ayi, ayi nēkpere unu, nāriọ kwa unu nime Onye-nwe-ayi Jisus, ka, dika unu natara n’aka-ayi otú unu nāghaghi ijeghari na ime ihe gātọ Chineke utọ, ọbuná dika unu nējeghari, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari.

2 N’ihi na unu matara iwu nile ayi nyere unu site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus.

3 N’ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ, ka unu ghara ikwa iko;

4 ka onye ọ bula nime unu matara otú ọ gēnwe nwunye nke aka ya n’odido-nsọ na nsọpuru,

5 ọ bughi n’ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke;

6 ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n’ihe a: n’ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike.

7 N’ihi na Chineke akpọghi ayi ka ayi buru ndi nādighi ọcha, kama n’odido-nsọ.

8 Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu.

9 Ma ọ dighi unu nkpà ka madu degara unu akwukwọ bayere ihunanya n’ebe umu-nna-unu nọ: n’ihi na unu onwe-unu bu ndi Chineke zíworo ihurita ibe-unu n’anya;

10 n’ihi na unu nēme ya n’ezie n’ebe umu-nna-ayi nile ndi bi na Masedọnia dum nọ. Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari;

11 ka unu nējisi kwa ike inọdu nwayọ, na ime ihe nile nke aka unu, na iji aka-unu lu ọlu, dika ayi nyere unu iwu;

12 ka unu we nējeghari dika o kwesiri unu n’ebe ha nọ, bú ndi nọ n’èzí, ka ihe ọ bula ghara kwa ikpa unu.

13 Ma ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere ndi nāda n’ura ọnwu, umu-nna-ayi; ka o we ghara iwuta unu, ọbuná dika ọ nēwuta ndi fọduru, ndi nēnweghi olile-anya.

14 N’ihi na asi na ayi kwere na Jisus nwuru si kwa n’ọnwu bilie, otú a ndi emere ka ha da n’ura ọnwu site n’aka Jisus, ọ bu ndia ka Chineke gēkuru ka ha so Ya bia.

15 N’ihi na nka ka ayi nāgwa unu n’okwu Onye-nwe-ayi, na ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi, na ayi agaghi-eburu ndi dara n’ura onwu uzọ ma-ọli.

16 N’ihi na Onye-nwe-ayi onwe-ya gēwere oké ikpọ-òkù, were olu isi-mọ-ozi, were kwa opì nke Chineke, si n’elu-igwe ridata: ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n’ọnwu bilie:

17 mb͕e ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n’igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mb͕e nile.

18 Ya mere werenu okwu ndia nākasirita ibe-unu obi.

Categories
I. NDI TESALỌNAIKA

I. NDI TESALỌNAIKA 5

1 Ma ọ dighi unu nkpà, umu-nna-ayi, ka edegara unu akwukwọ bayere oge ahu nile na ubọchi ahu nile.

2 N’ihi na unu onwe-unu matara nke-ọma na dika onye-ori nābia n’abali, otú a ka ubọchi nke Onye-nwe-ayi nābia.

3 Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.

4 Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, anọghi n’ọchichiri, ka ubọchi ahu we jide unu na mberede dika onye-ori:

5 n’ihi na unu onwe-unu nile bu umu nke ìhè, na umu nke ehihie: ayi abughi ndi nke abali, ma-ọbu nke ọchichiri;

6 ya mere otú a, ka ayi ghara iraru ura, dika ndi fọduru, kama ka ayi nēche nche nwe kwa anya-udo.

7 N’ihi na ndi nāraru ura nāraru ura n’abali; ndi nāṅubiga kwa manya ókè nāṅubiga n’abali.

8 Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi bu ndi nke ehihie, ka ayi nwe anya-udo, yikwasikwa ihe-agha ib͕ochi obi, bú okwukwe na ihunanya; ya na okpu-agha, bú ile-anya nzọputa.

9 N’ihi na Chineke edebeghi ayi inata iwe, kama inweta nzọputa site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist,

10 Onye nwuru n’ihi ayi, ka ọ gābu, ma ayi nēche nche ma ayi nāraru ura, ka ayi we so Ya dikọ ndu.

11 N’ihi nka nākasiritanu ibe-unu obi, wulirita kwa ibe-unu elu dika ulo, dika unu nēme kwa.

12 Ma ayi nēkpere unu, umu-nna-ayi, ka unu mata ndi nādọb͕u onwe-ha n’ọlu n’etiti unu, ndi bu kwa ndi-isi-unu nime Onye-nwe-ayi, ndi nādu kwa unu ọdú;

13 ka unu were kwa ihunanya sọpuru ha gabiga ókè nke-uku ri nne n’ihi ọlu-ha. Birinu n’udo n’etiti onwe-unu.

14 Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n’obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n’ebe madu nile nọ.

15 Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n’ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n’ebe ibe-unu nọ, na n’ebe madu nile nọ.

16 Nāṅurinu ọṅu mb͕e nile;

17 nēkpenu ekpere nēwepughi aka;

18 nēkelenu ekele n’ihe nile ọ bula: n’ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n’ebe unu nọ.

19 Unu emenyula Mọ Nsọ;

20 unu akpọla ibu-amuma ihe-efu;

21 nānwanu ihe nile; jidesienu ihe ọma ike;

22 unu etiyela aka n’aha ajọ ihe ọ bula.

23 Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n’uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādighi ita uta n’ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

24 O kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye ahu nākpọ unu, Onye gēme kwa ya.

25 Umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi.

26 Werenu isutu-ọnu di nsọ kele umu-nna-ayi nile.

27 Ewerem Onye-nwe-ayi b͕a unu iyi ka aguara umu-nna-ayi nile akwukwọ-ozi a.

28 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu.