Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 11

1 Ghọnu ndi nēṅomim, dika mu onwem bu kwa onye nēṅomi Kraist.

2 Ma anamaja unu na unu nēchetam n’ihe nile, jisi kwa ozizí ahu enyere n’aka-unu idebe ike, dika m’nyere ha n’aka-unu idebe.

3 Ma anamachọ ka unu mata na Kraist bu isi nke nwoke ọ bula; nwoke bu kwa isi nke nwanyi; Chineke bu kwa isi nke Kraist.

4 Nwoke ọ bula, mb͕e ọ nēkpe ekpere ma-ọbu mb͕e ọ nēbu amuma, ọ buru na o kpu ihe-nkpudo n’isi-ya, ọ nēme ka ihere me isi-ya.

5 Ma nwanyi ọ bula, mb͕e ọ dighi-ekpudo ihe n’isi-ya n’ikpe ekpere ma-ọbu n’ibu amuma, ọ nēme ka ihere me isi-ya: n’ihi na ya na nwanyi nke akọpuworo isi-ya bu otù ihe ahu.

6 N’ihi na asi na nwanyi ekpudoghi onwe-ya ihe n’isi, ka akpacha kwa agiri-isi-ya: ma asi na ọ buru nwanyi ihe-ihere ka akpacha agiri-isi-ya ma-ọbu ka akọpu isi-ya, ka ekpudo ya ihe n’isi.

7 N’ihi na nwoke ekwesighi n’ezie ka ekpudo ya ihe n’isi, ebe ọ bu onyinyo na otuto nke Chineke: ma nwanyi bu otuto nke nwoke.

8 N’ihi na nwoke esighi na nwanyi puta; kama nwanyi siri na nwoke puta:

9 n’ihi na ekèghi kwa nwoke n’ihi nwanyi; kama ekère nwanyi n’ihi nwoke:

10 n’ihi nka ka nwanyi kwesiri ikpu ihe-iriba-ama nke ike n’isi-ya, n’ihi ndi-mọ-ozi.

11 Otú ọ di, nwanyi adighi ma nwoke anọghi ya, nwoke adighi kwa ma nwanyi anọghi ya, nime Onye-nwe-ayi.

12 N’ihi na dika nwanyi siri na nwoke puta, otú a ka nwoke site-kwa-ra n’aka nwanyi; ma ihe nile si na Chineke puta.

13 Tulenu nime onwe-unu: ọ̀ kwesiri ka nwanyi kpere Chineke ma ekpudoghi ya ihe n’isi?

14 Ọbuná uzọ ekère madu, yà onwe-ya adighi-ezí unu, na, asi na nwoke nwere ogologo agiri-isi, na ọ buru ya ihe-ihere?

15 Ma ọ buru na nwanyi nwere ogologo agiri-isi, ọ buru ya ihe otuto: n’ihi na enyewo ya agiri-isi-ya n’ọnọdu ihe ib͕okwasi n’aru.

16 Ma ọ buru na unu nēchè na onye ọ bula bu onye nēse okwu, ayi onwe-ayi, ma-ọbu nzukọ Chineke, enweghi ọme-n’ala di otú a.

17 Ma n’inye unu iwu a, etoghm unu, na unu adighi-abiakọ n’otù ebe ka unu we dikari nma, kama ka unu we jọkari njọ.

18 N’ihi na ihe mbu, mb͕e unu biakọrọ na nzukọ, anurum na nkewa di iche iche nādi n’etiti unu; ekwe-kwa-ram ya ufọdu.

19 N’ihi na irọ-òtù di iche iche aghaghi idi kwa n’etiti unu, ka ndi anwaputaworo we ghọ ndi putara ìhè n’etiti unu.

20 Ya mere mb͕e unu biakọrọ n’otù ebe, ọ bughi iri nri-anyasi nke Onye-nwe-ayi:

21 n’ihi na madu nile n’otù n’otù, mb͕e unu nēri, nēburu ndi ọzọ uzọ rie nri-anyasi nke aka ha; agu we nāgu otù onye, onye ọzọ nāṅubiga kwa manya ókè.

22 Ọ̀ gābu na unu enweghi nọ̄ ulo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu nime ha? ma-ọbu ùnu nēlelì nzukọ Chineke, me kwa ndi nēnweghi ihe ka ihere me ha? Ọ̀ bu gini ka m’gāsi unu? #m’gēto unu? Etoghi m unu na nka.

23 N’ihi na mu onwem natara n’aka Onye-nwe-ayi ihe m’nye-kwa-ra unu n’aka idebe, na Onye-nwe-ayi Jisus n’abali ahu nke arara Ya nye n’aka madu, Ọ nara ob͕e achicha,

24 kele kwa, we nyawa ha, si, Nka bu arum, nke anēnye n’ihi unu: nēmenu nka ka unu we nēchetam.

25 Mb͕e ha risiri nri-anyasi, Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram: nēmenu nka, mb͕e ọ bula unu gāṅu ya, ka unu we nēchetam.

26 N’ihi na mb͕e ọ bula unu nēri achicha nka, nāṅu kwa iko ahu, unu nēkwusa ọnwu Onye-nwe-ayi rue mb͕e Ọ gābia.

27 Ya mere onye ọ bula nke gēri achicha ahu ma-ọbu ṅu iko ahu nke Onye-nwe-ayi mb͕e ọ nēkwesighi, ikpé aru na ọbara nke Onye-nwe-ayi gāma ya.

28 Ma ka madu nwaputa onwe-ya, otú a ka o ri kwa nime achicha ahu, ṅu kwa nime iko ahu.

29 N’ihi na onye nēri nāṅu kwa, ọ nēri nāṅu kwa ikpé nye onwe-ya, ma ọ buru na ọ tuleghi aru ahu.

30 N’ihi nka ọtutu madu n’etiti unu adighi ike nāria kwa nriaria, ndi dawo-kwa-ra n’ura nke ọnwu abughi madu ole-na-ole.

31 Ma ọ buru na ayi atule onwe-ayi, agaghi-ekpe ayi ikpé.

32 Ma mb͕e anēkpe ayi ikpé, Onye-nwe-ayi nēzí ayi ihe, site n’inye ayi ahuhu, ka ewe ghara imakọ ayi na uwa ikpé.

33 Ya mere, umu-nnam, mb͕e unu biakọrọ n’otù ebe iri ihe, cherenu ibe-unu.

34 Ọ buru na agu nāgu onye ọ bula, ya rie ihe n’ulo-ya; ka unu ghara ibiakọ n’uzọ gēweta ikpé. Ihe nile fọduru ka m’gēdozi mb͕e ọ bula m’gābia.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 12

1 Ma okwu bayere onyinye nke Mọ Nsọ, umu-nnam, achọghi m ka unu ghara imara.

2 Unu matara na mb͕e unu buri ndi mba ọzọ, anēdufu unu iso arusi ahu dara ob͕i, n’uzọ ọ bula anēdu unu.

3 N’ihi nka emem ka unu mara na ọ dighi onye ọ bula nke nēkwu okwu nime Mọ nke Chineke nāsi, Jisus bu anathema; ọ dighi kwa onye ọ bula puru isi, Jisus bu Onye-nwe-ayi, ma-ọbughi nime Mọ Nsọ.

4 Ma òkìkè nke onyinye-amara di, ma ọ bu otù Mọ Nsọ ahu.

5 Òkìkè nke ije-ozi di kwa, otù Onye-nwe-ayi ahu di kwa.

6 Òkìkè ihe alutaworo n’ọlu di kwa, ma ọ bu otù Chineke ahu, Onye nālusi ihe nile ike nime ayi nile.

7 Ma anēnye madu nile n’otù n’otù n’etiti ayi ngosi nke Mọ Nsọ ka o we ba urù.

8 N’ihi na anēsite n’aka Mọ Nsọ nye otù onye okwu amam-ihe; anēnye kwa onye ọzọ okwu ọmuma, di ka Mọ ahu nāchọ:

9 nye kwa ibe-ya okwukwe, nime otù Mọ ahu; nye kwa onye ọzọ onyinye-amara nile ime ka aru madu di ike, nime otù Mọ nka;

10 nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu:

11 ma ihe ndia nile ka otù Mọ ahu nālusi ike, nání Ya, nēkère madu nile n’otù n’otù, ebe onye ọ bula nọ O kère ya dika Ọ nāchọ.

12 N’ihí na dika aru-ayi bu otù, nwe kwa ọtutu ihe di ya nime, ma ihe nile nke di n’aru, ọ bu ezie na ha di ọtutu, ma ha bu otù aru; otú a ka Kraist di kwa.

13 N’ihi na nime otù Mọ Nsọ ka emere ayi onwe-ayi nile baptism ibà n’otù aru, ma ayi bu ndi-Ju ma-ọbu ndi-Grik, ma ayi bu ndi-orù ma-ọbu ndi nwere onwe-ha; eme-kwa-ra ka ayi nile ṅua nime otù Mọ Nsọ.

14 N’ihi na aru-ayi abughi nání otù ihe nke di ya nime, kama ọ bu ọtutu ihe.

15 Ọ buru na ukwu gāsi, N’ihi na abughi m aka, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n’ihi nka.

16 Ọ buru kwa na nti gāsi, N’ihi na abughi m anya, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n’ihi nka.

17 Ọ buru na aru dum bu anya, òle ebe ka ihe-ọnunu di? Ọ buru na aru dum bu ihe-ọnunu, òle ebe ka ihe inu isìsì di?

18 Ma otú ọ di, Chineke debere ihe di n’aru, ha nile n’otù n’otù, nime aru, dika Ọ chọrọ.

19 Ma asi na ha nile bu otù ihe di n’aru, òle ebe ka aru di?

20 Ma otú ọ di, ha di ọtutu ihe di n’aru, ma ha bu otù aru.

21 Ọzọ, anya apughi isi aka, Nkpà gi akpaghi m: ọzọ kwa, isi apughi isi ukwu, Nkpà unu akpaghm.

22 Kama ọ bu ihe ahu di n’aru nke anēchè na ha adighi ike kari bu ihe di nkpà kari nke-uku:

23 akuku ahu nke aru, nke ayi nēchè na adighi-asọpuru ha dika akuku ọzọ, akuku ndia ka ayi nēnyebiga kwa nsọpuru ókè kari; akuku aru nke ayi nke nādighi kwa nma n’anya bu nke mabigara ókè kari;

24 ma nkpà akpaghi akuku aru nke ayi nke mara nma: kama Chineke tigwara aru n’otù, akuku aru ahu nke nsọpuru fọduru ya inwe ka Ọ nēnyebiga nsọpuru ókè kari;

25 ka nkewa we ghara idi n’aru; kama ka ihe di n’aru we nēcheb͕u onwe-ha nye ibe-ha n’otù uzọ ahu.

26 Ọ buru kwa na otù ihe nke di n’aru nāhu ahuhu, ihe nile di n’aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n’aru otuto, ihe nile di n’aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu.

27 Ma unu onwe-unu bu aru nke Kraist, buru kwa ihe di n’aru, onye ọ bula n’akuku nke ya.

28 Chineke debe-kwa-ra ufọdu nime nzukọ-Ya, nke-mbu ndi-ozi, nke-abua ndi-amuma, nke-atọ ndi-ozizí, nke so ha ọlu di ike, nke so ha onyinye-amara di iche iche ime ka aru madu di ike, iye-aka, ichi-isi, aha asusu di iche iche.

29 Ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-ozi? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-amuma? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-ozizí? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi nālu ọlu di ike?

30 ọ̀ gābu na ha nile nwere onyinye-amara ime ka madu di ike? ọ̀ gābu na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu? ọ̀ gābu na ha nile nāsughari asusu?

31 Ma werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara ndia nke kari uku. Tukwasi ihe ndia anamegosi kwa unu uzọ nke kachasi nma.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 13

1 Asi na ejim asusu di iche iche nke madu na nke ndi-mọ-ozi nēkwu okwu, ma enweghi m ihu-n’anya, aghọwom ọla nāra ara, ma-ọbu ájà ọla nāda udà.

2 Asi kwa na enwerem onyinye ibu-amuma, mata kwa ihe-omimi nile na ihe-ọmuma nile; asi kwa na enwerem okwukwe nile, nke mere m’gēnwe ike ibubiga ugwu, ma enweghi m ihu-n’anya, abughm ihe ọ bula.

3 Asi kwa na ewerem ihe nile m’nwere zùa ndi-ob͕eye, asi kwa na araram arum nye ka ewe rem ọku, ma enweghm ihu-n’anya, ọ baghm urù ọ bula.

4 Ihu-n’anya nwere ogologo-ntachi-obi, o nwe-kwa-ra obi-ọma; ihu-n’anya adighi-ekwo ekworo; ihu-n’anya adighi-anya isi, ọ dighi-afuli onwe-ya elu,

5 ọ dighi-eme ihe nādighi nma n’anya, ọ dighi-achọ ihe nke aka ya, oké iwe adighi-ewe ya, ọ dighi-agu ihe ọjọ emere ya;

6 ọ dighi-aṅuri ọṅu nime ajọ omume, ma ọ nēso ezi-okwu ṅurikọ ọṅu;

7 ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n’ihe nile.

8 Ihu-n’anya adighi-ada mb͕e ọ bula: ma ọ buru na ibu-amuma di, agēme ka ha ghara idi irè; ọ buru kwa na asusu di iche iche di, ha gāgwu; ọ buru kwa na ihe-ọmuma di, agēme ka ọ ghara idi irè.

9 N’ihi na ayi mara na nkpirikpi, ayi nēbu kwa amuma na nkpirikpi:

10 ma mb͕e ọ bula ihe nke zuru okè gābia, agēme ihe, nke di na nkpirikpi ka ọ ghara idi irè.

11 Mb͕e m’buri nwa ọhu, anamekwu dika nwa ọhu, anamatukwasi uche n’ihe dika nwa ọhu, anamagu ihe dika nwa ọhu: ub͕u a mb͕e m’ghọworo okenye, emewom ka omume nwa ọhu ghara idi irè.

12 N’ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m’mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m’gāmazu dika amazu-kwa-ram.

13 Ma ub͕u a ka okwukwe, olile-anya, ihu-n’anya, ihe atọ ndia, nānọgide; ma nke kachasi n’ihe ndia bu ihu-n’anya.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 14

1 Nāb͕asonu ihu-n’anya; otú ọ di, werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara nile nke Mọ Nsọ, ma nāchọkarinu ka unu bū amuma.

2 N’ihi na onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ọ dighi-agwa madu okwu, kama ọ nāgwa Chineke; n’ihi na ọ dighi onye ọ bula nānu ihe ọ nēkwu; ma o ji mọ-ya nēkwu ihe-omimi.

3 Ma onye nēbu amuma nāgwa madu okwu nke iwuli-elu dika ulo, na nke nkasi-obi, na nke ngugu-obi.

4 Onye ji asusu di iche nēkwu okwu nēwuli onwe-ya elu dika ulo; ma onye nēbu amuma nēwuli nzukọ Kraist elu dika ulo.

5 Otú ọ di, anamachọ ka unu nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma achọkaririm ka unu nēbu amuma: onye nēbu amuma ka kwa onye ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma-ọbughi na ọ nāsughari ya, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.

6 Ma otú ọ di, umu-nnam, asi na agamabiakute unu were asusu di iche iche nēkwu okwu, ùrù gini ka m’gābara unu, asi na agwaghi m unu okwu n’uzọ nkpughe, ma-ọbu n’uzọ ihe-ọmuma, ma-ọbu n’uzọ ibu-amuma, ma-ọbu n’uzọ ozizí?

7 Ọbuná ihe nējighi ndu, mb͕e olu-ha nāda udà, ma ọ bu ọ̀jà ma-ọbu ubọ-akwara, ọ buru na ọ dighi ihe di iche n’olu-ha, àgēsi aṅa mara ihe anāfù ma-ọbu nke anākpọ?

8 N’ihi na asi kwa na opì nāda nke anāmaghi isi-ya, ònye gākwadebe onwe-ya ije agha?

9 Otú a unu onwe-unu kwa, ma ọ buru na unu ejighi ire kwu okwu di nfe ighota, àgēsi aṅa mara ihe anēkwu? n’ihi na unu ganēkwu okwu nye ifufe.

10 Agāsi na ọtutu aha olu di iche iche di n’uwa, ọ dighi kwa ihe ọ bula nke nēnweghi olu.

11 Ya mere asi na amataghm isi olu ahu, m’gābu onye nāsu asusu ọzọ n’anya onye ahu nēkwu okwu, onye ahu nēkwu okwu gābu kwa onye nāsu asusu ọzọ n’anyam.

12 Otú a unu onwe-unu kwa, ebe unu bu ndi nēwere obi nānu ọku chọ onyinye nile nke Mọ Nsọ, nāchọnu ka unu we babiga ókè nime ha, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.

13 N’ihi nka onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ya kpere Chineke ka o we sugharia.

14 N’ihi na asi na ejim asusu di iche nēkpe ekpere, mọm nēkpe ekpere, ma uchem amighi nkpuru.

15 Ọ̀ bu gini kwa? m’gēji mọm kpe ekpere, ma m’gēji kwa uchem kpe ekpere: m’gēji mọm bù abù ọma, ma m’gēji kwa uchem bù abù ọma.

16 Ma emeghi otú a, onye nọ n’ọnọdu onye nāmutaghi akwukwọ gēsi aṅa si Amen ahu mb͕e i nēkele ekele, ma ọ buru na i ji mọ-gi nāgọzi, ebe ọ nāmataghi ihe ọ bula i nēkwu?

17 N’ihi na ọ bu ezie na gi onwe-gi nēkele nke-ọma, ma ewulighi ibe-gi elu dika ulo.

18 Ekelem Chineke, na ejim asusu di iche iche nēkwu okwu kari unu nile:

19 otú ọ di, nime nzukọ Kraist anamachọ ka m’ji uchem kwu nkpuru okwu ise, ka m’were okwu-ọnum zí kwa ndi ọzọ ihe, kari ikwu orú nnù okwu na nnù ise n’asusu di iche.

20 Umu-nnam, unu abula umu-ntakiri n’uche-unu: kama burunu umu ọhu n’obi ọjọ, ma n’uche-unu burunu ndi tozuru okè.

21 Nime iwu Chineke ka edeworo ya, si, M’gēji madu ndi nāsu asusu di iche, ji kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi di iche, gwa ndi nka okwu; ma ọbuná otú a ha agaghi-anu olum, ka Onye-nwe-ayi kwuru.

22 Ya mere asusu di iche iche ndia, emere ka ha buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi kwere ekwe, kama nye ndi nēkweghi ekwe: ma emere ibu-amuma ka ọ buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi nēkweghi ekwe, kama nye ndi kwere ekwe.

23 Ya mere asi na nzukọ Kraist dum biakọrọ n’otù ebe, asi kwa na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma ọ buru na ndi nāmutaghi akwukwọ ma-ọbu ndi nēkweghi ekwe gābata, hà agaghi-asi na anya adighi unu nma?

24 Ma asi na ha nile ebu amuma, ma ọ buru na onye nēkweghi ekwe ma-ọbu onye nāmutaghi akwukwọ gābata, ha nile nātu ya nmehie-ya n’anya, ha nile nēkpe kwa ya ikpé;

25 ihe-nzuzo nile nke obi-ya aputa ìhè; ọ gēsi otú a da kpuchie iru-ya n’ala kpọ kwa isi ala nye Chineke, nēkwuputa na ọ bu ezie na Chineke nọ n’etiti unu.

26 Ọ̀ bu gini kwa, umu-nnam? mb͕e ọ bula unu biakọrọ n’otù ebe, unu nile n’otù n’otù ji abù ọma, ji ihe-ozizí, ji ihe-nkpughe, ji asusu di iche, ji isughari-asusu. Ka eme ihe nile ka ewe wuli madu nile elu dika ulo.

27 Ọ buru na onye ọ bula eji asusu di iche nēkwu okwu, ka ọ buru ihe ra ka madu abua gēkwu, ma ka ha ghara ika madu atọ, ka ha kwu kwa n’usoro; ka otù onye sughari kwa:

28 ma asi na ọ dighi onye nāsughari asusu nọ n’etiti unu, ya kpuchie ọnu-ya nime nzukọ Kraist; ya gwa onwe-ya na Chineke okwu.

29 Ka ndi-amuma kwu kwa okwu, madu abua ma-ọbu madu atọ, ka ndi ọzọ tule kwa.

30 Ma asi na ekpughere onye ọzọ nke nọdu n’akuku ya ihe, ka onye mbu kpuchie ọnu-ya.

31 N’ihi na unu nile puru ibu amuma n’otù n’otù, ka madu nile we muta ihe, ka ewe kasi kwa madu nile obi;

32 anēdo kwa mọ nile nke ndi-amuma n’okpuru ndi-amuma;

33 n’ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ.

34 Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n’ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n’okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa.

35 Ọ buru kwa na ha nāchọ imuta ihe ọ bula, ka ha jua di nke aka ha n’ulo: n’ihi na ọ bu ihe-ihere ka nwanyi kwue okwu nime nzukọ Kraist.

36 Ọ̀ gābu na okwu Chineke si n’ebe unu nọ puta? ma-ọbu ò ruru nání unu?

37 Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye-amuma, ma-ọbu onye nwere onyinye Mọ Nsọ, ya mazu ihe m’nēdegara unu n’akwukwọ, na ha bu ihe Onye-nwe-ayi nyere n’iwu.

38 Ma ọ buru na onye ọ bula amaghi ihe ndia, ọ bu onye anāmaghi ama.

39 Ya mere, umu-nnam, werenu obi nānu ọku chọ ka unu bu amuma, unu eb͕ochi-kwa-la iji asusu di iche iche nēkwu okwu.

40 Ma ka eme ihe nile n’uzọ di nma n’anya, na n’usoro.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 15

1 Ma emem ka unu mara, umu-nnam, ozi ọma ahu nke m’zìri unu, nke unu nata-kwa-ra, nke unu nēguzo kwa nime ya,

2 nke esite-kwa-ra zọputa unu, ma ọ buru na unu jidesie ya ike, bú aha okwu m’ji zì unu ozi ọma ahu, ma asi na ọ bughi na unu kwere n’efu.

3 N’ihi na enyerem n’aka-unu na mbu ihe m’nata-kwa-ra idebe, na Kraist nwuru n’ihi nmehie-ayi nile, dika ihe edeworo n’akwukwọ nsọ si di;

4 na elì-kwa-ra Ya; na emewo-kwa-ra ka O si n’ọnwu bilie n’ubọchi nke-atọ, dika ihe edeworo n’akwukwọ nsọ si di;

5 na O me-kwa-ra ka Kifas hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi iri na abua ahu hu Ya anya;

6 emesia O mere ka ndi kari nnù madu na ọgu ise n’etiti umu-nna-ayi hu Ya anya n’otù mb͕e, ndi ka n’ọnu-ọgugu n’etiti ndi ahu nānọgide rue ub͕u a, ma ufọdu adawo n’ura ọnwu;

7 emesia O mere ka Jemes hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi nile hu Ya anya;

8 ma n’ikpe-azu ha nile, dika nwa amukworo amukwo, O mere ka mu onwem hu kwa Ya anya.

9 N’ihi na mu onwem dikarisiri ntà n’etiti ndi-ozi, ebe m’nērughi ka akpọm onye-ozi, n’ihi na esob͕urum nzukọ Chineke.

10 Ma site n’amara Chineke abum ihe m’bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n’ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.

11 Ya mere ma ọ buru mu onwem, ma-ọbu ndi ahu, otú a ka ayi nēkwusa, otú a ka unu kwe-kwa-ra.

12 Ma ọ buru na anēkwusa na emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ùfọdu n’etiti unu si aṅa nēkwu na nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi?

13 Ma ọ buru na nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi, emeghi kwa ka Kraist si n’ọnwu bilie:

14 ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n’ọnwu bilie, ya mere ihe ayi nēkwusa bu ihe-efu, okwukwe-unu bu kwa ihe-efu.

15 Ọzọ kwa, anāhu na ayi bu ndi-àmà ugha nke Chineke; n’ihi na ayi b͕ara àmà megide Chineke na O mere ka Kraist ahu si n’ọnwu bilie; bú Onye Ọ nēmeghi ka O si n’ọnwu bilie, ma ọ buru na ọ bu ezie na emeghi ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie.

16 N’ihi na asi na emeghi ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie, emeghi kwa ka Kraist si n’ọnwu bilie:

17 ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n’ọnwu bilie, okwukwe-unu bu ihe-efu; unu nānọ na nmehie nile unu ub͕u a.

18 Ya mere ndi da-kwa-ra n’ura ọnwu nime Kraist lara n’iyì.

19 Asi na ọ bu nání na ndu a ka ayi nweworo olile-anya-ayi nime Kraist, ayi bu ndi kwesiri ebere kari madu nile.

20 Ma otú ọ di, emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, nkpuru mbu nke ndi daworo n’ura ọnwu.

21 N’ihi na ebe ọnwu sitere n’aka madu, nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu site-kwa-ra n’aka madu.

22 N’ihi na dika ọnwu diri madu nile nime Adam, ọ bu kwa otú a ka agēme ka madu nile di ndu nime Kraist ahu.

23 Ma madu nile n’otù n’otù n’usoro nke aka ha: Kraist, dika nkpuru mbu; emesia ndi nke Kraist, n’ọbibia-Ya.

24 Emesia ọgwugwu ihe nile gābia, mb͕e ọ bula Ọ gārara ala-eze-Ya nye n’aka Chineke, Onye bu kwa Nna; mb͕e ọ bula Ọ gēmewori ka ọbubu-isi nile na ichi-isi nile na ike nile ghara idi irè.

25 N’ihi na Ọ ghaghi ibu eze, rue mb͕e Ọ gēdebewori ndi-iro-Ya nile n’okpuru ukwu-Ya.

26 Dika onye-iro ikpe-azu, agaje ime ka ọnwu ghara idi irè.

27 N’ihi na, Ihe nile ka O doro n’okpuru ukwu-Ya abua. Ma mb͕e ọ bula O gēkwuwori, si, Edowo ihe nile n’okpuru Ya, ọ putara ìhè na Ọ nọghi ya, bú Onye doro ihe nile n’okpuru Ya.

28 Ma mb͕e ọ bula agēdowori ihe nile n’okpuru Ya, mb͕e ahu ka agēdo Ọkpara ahu Onwe-ya n’okpuru Onye ahu Nke doro ihe nile n’okpuru Ya, ka Chineke we buru ihe nile nime ihe nile.

29 N’ihi na asi na ọ dighi otú a, gini ka ha gēme, bú ndi anēme baptism n’ọnọdu ndi nwuru anwu? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie ma-ọli, ọ̀ bu kwa gini mere anēme ha baptism n’ọnọdu ha?

30 Gini me-kwa-ra ayi onwe-ayi nānọ n’ize-ndu oge hour nile ọ bula?

31 Ejim inya-isi ahu n’aru-unu, umu-nnam, nke m’nānya nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, we kwusie ike na anamanwu kwa-ubọchi.

32 Ọ buru na abumri onye nālu ọ̀gù megide anu-ọhia n’Efesọs dika madu si eme, ùrù gini baram? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie, ka ayi rie ṅu kwa, n’ihi na echi ka ayi gānwu.

33 Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma.

34 Sinu n’ura manya teta n’uzọ ezi omume, unu emehie-kwa-la; n’ihi na ufọdu nēnwe amaghi-ihe bayere Chineke: anamekwu nka ka m’me unu ihere n’iru.

35 Ma otù onye gāsi, Èsi aṅa eme ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie? ọ̀ bu kwa ahà aru gini ka ha ji bia?

36 Onye nēnweghi uche, adighi-eme ka nkpuru gi onwe-gi nāgha di ndu, ma ọ buru na ọ nwughi anwu:

37 ihe i nāgha kwa, ọ bughi aru gāputa ka i nāgha, kama ọ bu nkpuru efu, ma eleghi anya ọ gābu ọka, ma-ọbu nkpuru ọ bula nime nkpuru fọduru;

38 ma Chineke nēnye ya aru dika Ọ chọrọ, nēnye kwa nkpuru ọ bula nime nkpuru nile aru nke aka ya.

39 Anu-aru nile abughi otù anu-aru: kama otù anu-aru nke madu di, anu-aru ọzọ nke anumanu di kwa, anu-aru ọzọ nke nnunu di kwa, anu-aru ọzọ nke azù di kwa.

40 Aru nke elu-igwe na aru nke uwa di kwa: ma ebube nke aru nke elu-igwe bu otù, ebube nke aru nke uwa di kwa iche.

41 Otù ebube nke anyanwu di, ebube ọzọ nke ọnwa di kwa, ebube ọzọ nke kpakpando di kwa; n’ihi na otù kpakpando di iche n’aru kpakpando ọzọ n’ebube.

42 Otú a ka nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu di kwa. Anāgha ya n’ire-uré; anēme ka o si n’ọnwu bilie n’ereghi-uré:

43 anāgha ya n’ihe-ihere; anēme ka o si n’ọnwu bilie n’ebube: anāgha ya n’adighi-ike; anēme ka o si n’ọnwu bilie n’ike:

44 anāgha ya aru nke nkpuru-obi nāchi; anēme ka o si n’ọnwu bilie aru nke Mọ di nime ya nāchi. Ọ buru na aru nke nkpuru-obi nāchi di, aru nke Mọ nāchi di kwa.

45 Otú a ka edewo-kwa-ra ya n’akwukwọ, si, Madu mbu, bú Adam, ghọrọ nkpuru-obi di ndu. Adam ikpe-azu ghọrọ mọ nke nēnye ndu.

46 Otú ọ di, nke Mọ nāchi ebughi uzọ, kama ọ bu nke nkpuru-obi nāchi; emesia nke Mọ nāchi soro.

47 Madu mbu sitere n’ala, eji-kwa-ra ájá kpu ya: Madu nke-abua sitere n’elu-igwe.

48 Aha madu onye ahu ejiri ájá kpu di, madu di otú a ka ndi eji ájá kpu di kwa: ọzọ, aha madu Onye elu-igwe ahu di, madu di otú a ka ndi elu-igwe di kwa.

49 Dika ayi yiri kwa onyinyo nke onye ahu eji ájá kpu, ayi gēyiri kwa onyinyo nke Onye elu-igwe ahu.

50 Ma nka ka m’nēkwu, umu-nnam, na anu-aru na ọbara apughi iketa ala-eze Chineke; ihe nēre uré eketaghi kwa ereghi-uré.

51 Le, agwam unu ihe-omimi: Ọ bughi ayi nile gāda n’ura ọnwu, ma agēnwo ayi nile,

52 n’oge dikarisiri ntà, n’otù ntabi-anya, mb͕e agāfù opì ikpe-azu: n’ihi na agāfù opì, agēme kwa ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie nāpughi ire uré, agēnwo kwa ayi onwe-ayi.

53 N’ihi na aru a nke puru ire uré aghaghi iyikwasi ereghi-uré, aru a nke puru inwu anwu aghaghi iyikwasi anwughi-anwu.

54 Ma mb͕e ọ bula aru a nke puru ire uré gēyikwasiwori ereghi-uré, mb͕e aru a nke puru inwu anwu gēyikwasiwori anwughi-anwu kwa, mb͕e ahu okwu ahu edeworo n’akwukwọ nsọ gēme, bú, Eloro ọnwu rue nmeri.

55 Ọnwu, òle ebe nmeri-gi di? Ọnwu, òle ebe ihe-ọb͕ub͕a-gi di?

56 Ihe-ọb͕ub͕a nke ọnwu bu nmehie; ike nke nmehie bu kwa iwu:

57 ma ekele diri Chineke, Onye nēnye ayi nmeri site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

58 Ya mere, umu-nnam m’huru n’anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n’ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 16

1 Ma okwu bayere ùtú anāturu ndi nsọ, dika m’nyere nzukọ Kraist di na Galetia iwu, unu onwe-unu me kwa otú a.

2 Kwa ubọchi mbu n’ízù ubọchi asa ka unu nile n’otù n’otù debe ihe n’ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara ùtú mb͕e ọ bula m’gābia.

3 Ma mb͕e ọ bula m’biaruru, ndi ọ bula unu gānwaputa, m’gēwere akwukwọ-ozi ziga ndi ahu ibūru ihe-amara-unu je Jerusalem:

4 ma asi na ọ kwesiri ka mu onwem je kwa, ha gēsom je.

5 Ma m’gābiakute unu, mb͕e ọ bula m’gāgabigasi nime Masedọnia; n’ihi na agajem igabiga nime Masedọnia;

6 ma eleghi anya na nke unu ka m’gānọgide, ma-ọbu nọbiga kwa na mb͕e oyi, ka unu we dupum n’ijem ebe ọ bula m’nāga.

7 N’ihi na achọghi m ihu unu ub͕u a n’uzọ ijem; n’ihi na anamele anya na m’gānọgide na nke unu oge ufọdu, ma asi na Onye-nwe-ayi gēkwe.

8 Ma m’gānọgide n’Efesọs rue oge Pentikọst;

9 n’ihi na emegheworom ọnu-uzọ di uku nke agēji kwa lusi ọlu ike, ọzọ, ọtutu ndi nēmegidem.

10 Ma asi na Timọti abia, lezienu anya ka ọ nọgide na nke unu nātughi egwu; n’ihi na ọ nālu ọlu Onye-nwe-ayi, dika mu onwem nālu kwa:

11 ya mere, ka onye ọ bula ghara ikpọ ya ihe-efu. Kama dupunu ya n’ije-ya n’udo, ka o we biakutem: n’ihi na anamele anya na ọ gēso umu-nna-ayi bia.

12 Ma okwu bayere Apọlos nwa-nna-ayi, ariọrọm ya ọtutu aririọ ka o so umu-nna-ayi biakute unu: ma ihe ọ chọrọ abughi ka ọ bia ub͕u a ma-ọli; ma ọ gābia mb͕e ọ bula o nwere oghere.

13 Nēchenu nche, nēguzosinu ike n’okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.

14 Ka eme ihe-unu nile n’ihu-n’anya.

15 Ma ariọm unu, umu-nnam, (unu matara èzí-na-ulo Stefanas, na ọ bu nkpuru mbu nke Akaia, na ha do-kwa-ra onwe-ha ijere ndi nsọ ozi),

16 ka unu onwe-unu do kwa onwe-unu n’okpuru madu di otú a, na n’okpuru onye ọ bula nke soro ayi nālukọ ọlu, onye nādọb͕u kwa onwe-ya n’ọlu.

17 Anamaṅuri kwa ọṅu n’ọbibia nke Stefanas na Fọtunetọs na Akaikọs: n’ihi na ndi ahu mezuru ihe fọduru unu imerem.

18 N’ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a.

19 Nzukọ Kraist nile nke di n’Esia nēkele unu. Akwila na Priska nēkele unu ọtutu ekele nime Onye-nwe-ayi, ha na nzukọ Kraist nke di n’ulo-ha.

20 Umu-nna-ayi nile nēkele unu. Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu.

21 Ekele nke mu Pọl, nke m’ji aka nkem de.

22 Ọ buru na onye ọ bula adighi-ahu Onye-nwe-ayi n’anya, ka ọ buru anathema. Onye-nwe-ayi nābia.

23 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.

24 Ihu-n’anya nkem diyere unu nile nime Kraist Jisus. Amen.