Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 21

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Nebot, bú onye Jezreel, nwere ubi-vine, nke di na Jezreel, n’akuku ulo uku Ehab, bú eze Sameria.

2 Ehab we gwa Nebot okwu, si, Nyem ubi-vine-gi, ka o we burum ubi ab͕ara ogige ebe anāku akwukwọ nri, n’ihi na nke ahu di nso n’akuku ulom; ka m’nye kwa gi ubi-vine di nma kari ya n’ọnọdu ya: ma ọ buru na ọ di nma n’anya-gi, ka m’nye gi ego ruru ọnu-ahia-ya.

3 Nebot we si Ehab, Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú inye gi ihe-nketa nnam-hà.

4 Ehab we ba n’ulo-ya n’obi arọ́ na nb͕aru-iru, n’ihi okwu nke Nebot, bú onye Jezreel, gwara ya: n’ihi na ọ siri, M’gaghi-enye gi ihe-nketa nnam-hà. O we dina n’ihe-ndina-ya, chigharia iru-ya, o righi kwa nri.

5 Jezebel, bú nwunye-ya, we biakute ya, gwa ya okwu, si, Gini me-kwa-ra mọ-gi di arọ́, i nērighi kwa nri?

6 Ọ si ya, N’ihi na agwaram Nebot, bú onye Jezreel, okwu, si ya, Nyem ubi-vine-gi n’ego; ma-ọbu, ọ buru na ọ tọ gi onwe-gi utọ, ka m’nye gi ubi-vine ọzọ n’ọnọdu ya: o we si, M’gaghi-enye gi ubi-vine nkem.

7 Jezebel, bú nwunye-ya, si ya, Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu eze nāchi Israel ub͕u a? bilie, rie nri, ka obi-gi di nma: mu onwem gēnye gi ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel.

8 O we de akwukwọ n’aha Ehab, were nb͕a-aka-akàrà-ya ka ha, zigara ndi-okenye akwukwọ ahu, ziga-kwa-ra ndi amara aha-ha ndi nọ n’obodo-ya, ndi ha na Nebot bi.

9 O we de n’akwukwọ ahu, si, Kpọsanu obu-bu-ọnu, me ka Nebot nọdu n’isi ọnọdu n’etiti ndi Israel:

10 me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n’iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.

11 Ndikom obodo-ya, bú ndi-okenye na ndi amara aha-ha ndi bi n’obodo-ya, we me dika Jezebel zitere ha ozi, dika edere ya n’akwukwọ nke o zitere ha.

12 Ha kpọsara obubu-ọnu, me ka Nebot nọdu n’isi ọnọdu n’etiti ndi Israel.

13 Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n’iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n’iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.

14 Ha we zigara Jezebel ozi, si, Atub͕uwo Nebot na nkume, ọ nwuwo kwa.

15 O rue, mb͕e Jezebel nuru na atub͕uwo Nebot na nkume, na ọ nwuwo kwa, na Jezebel siri Ehab, Bilie, nweta ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, nke ọ juru inye gi n’ego: n’ihi na Nebot adighi ndu, kama ọ nwuwo.

16 O rue, mb͕e Ehab nuru na Nebot anwuwo, na Ehab biliri iridaru ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, inweta ya.

17 Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si,

18 Bilie, ridata izute Ehab, bú eze Israel, onye bi na Sameria; le, ọ nọ n’ubi-vine Nebot, ebe ọ ridara inweta ya.

19 Ma i gāgwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ì b͕uwo ọchu, nweta kwa? I gāgwa kwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N’ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi.

20 Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n’ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.

21 Le, M’nēme ka ihe ọjọ bakute gi, M’gēkpochapu ndi-gi fọduru, M’gēbipu kwa n’aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n’Israel, ka Jehova kwuru:

22 M’gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija, n’ihi nkpasu-iwe nke i ji kpasum iwe, me kwa ka Israel mehie.

23 Ọzọ kwa, Jehova kwuru okwu bayere Jezebel, si, Nkita gēri Jezebel n’ékpè Jezreel.

24 Onye nke Ehab nke nwuru anwu n’obodo, nkita gēri ya; onye nke nwuru anwu n’ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya.

25 (Otú ọ di, ọ dighi onye di ka Ehab, onye rere onwe-ya ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, onye Jezebel, bú nwunye-ya, rafuru.

26 Ọ we me ihe-árú nke-uku n’ijeso arusi di iche iche, dika ihe nile si di nke ndi-Amorait mere, ndi Jehova napuru ala-ha n’iru umu Israel.)

27 O rue, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, na ọ dọwara uwe-ya nile, tukwasi ákwà-nkpe n’anu-aru-ya, bue ọnu, dina n’ákwà-nkpe, jegharia nwayọ.

28 Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si,

29 Ì huwo na Ehab ewedawo onwe-ya n’ala n’irum? n’ihi na o wedawo onwe-ya n’ala n’irum, M’gaghi-eme ka ihe ọjọ ahu bia n’ubọchi-ya: ọ bu n’ubọchi nwa-ya ka M’gēme ka ihe ọjọ ahu biakwasi ulo-ya.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 22

1 Ha we nọdu arọ atọ agha adighi n’etiti Siria na Israel.

2 O rue, n’arọ nke-atọ, na Jehoshafat, bú eze Juda, ridakuru eze Israel.

3 Eze Israel we si ndi-orù-ya, Ùnu mara na ọ bu ayi nwe Remot-gilead, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti, ghara inaputa ya n’aka eze Siria?

4 Ọ si Jehoshafat, Ì gēsorom je agha na Remot-gilead? Jehoshafat we si eze Israel, Dika m’di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di.

5 Jehoshafat we si eze Israel, Biko, buru uzo ju ase okwu Jehova.

6 Eze Israel we chikọta ndi-amuma, ra ka nnù ndikom, ọ si ha, M’gēje imegide Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu m’gārapu? Ha we si, Rigo; Onye-nwe-ayi gēnye kwa ya n’aka eze.

7 Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n’ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n’aka-ya?

8 Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n’aka-ya, bú Maikaia nwa Imla: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n’ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a.

9 Eze Israel we kpọ otù onye nēje ozi, si, Me ka Maikaia nwa Imla bia ọsọsọ.

10 Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n’oche-eze-ya, yiri uwe-ha, n’ebe-nzọcha-ọka n’oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n’iru ha.

11 Zedekaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia.

12 Ndi-amuma nile nēbu kwa amuma otú a, si, Rigorue Remot-gilead, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma: Jehova enyewo kwa ya n’aka eze.

13 Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Biko, le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe.

14 Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n’ezie ihe Jehova gāsim, nke ahu ka m’gēkwu.

15 O we biakute eze. Eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu àyi gārapu? Ọ si ya, Rigo, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma; Jehova enyewo kwa ya n’aka eze.

16 Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n’aha Jehova?

17 Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n’ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n’ulo-ya n’udo.

18 Eze Israel we si Jehoshafat, Àsighm i na ọ gaghi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ?

19 Ọ si, N’ihi nka nuru okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n’oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n’akuku Ya n’aka-nri-Ya na n’aka-ekpe-Ya.

20 Jehova we si, Ònye gārafu Ehab, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Ọtù onye we si otú a; onye ọzọ si-kwa-ra otú a.

21 Mọ ahu we puta, guzo n’iru Jehova, si, Mu onwem gārafu ya.

22 Jehova we si ya, Gini ka i gēji? Ọ si, M’gāpu, buru mọ okwu-ugha n’ọnu ndi-amuma-ya nile. Ọ si, I gārafu ya, i gēnwe kwa ike: pua, me otú a.

23 Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n’ọnu ndi-amuma-gi ndia nile; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi.

24 Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n’ebe m’nọ gabiga igwa gi okwu?

25 Maikaia we si, Le, i ganāhu n’ubọchi ahu, mb͕e i gābà n’ime-ulo nke di n’ime-ulo izo onwe-gi.

26 Eze Israel we si, Kuru Maikaia, me ka ọ laghachikuru Emon, bú onye-isi obodo, laghachikuru kwa Joash, bú nwa eze;

27 Igāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n’ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m’gābia n’udo.

28 Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n’udo, Jehova ekwughi okwu n’ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n’uwa, unu nile.

29 Eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, we rigorue Remot-gilead.

30 Eze Israel we si Jehoshafat, M’gēnwoghari onwem, ba n’agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya, ba n’agha.

31 Ma eze Siria nyere orú ndi-isi na iri na abua nke ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya.

32 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, N’ezie eze Israel ka ọ bu; ha we wezuga onwe-ha ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu.

33 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru na ya onwe-ya abughi eze Israel, ha we si n’iso ya laghachi.

34 Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n’etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m’si n’ọmuma-ulo-ikwū pua; n’ihi na ọria nāriam.

35 Agha we la elu n’ubọchi ahu: ewe me ka eze guzogide n’ub͕ọ-ala-ya imegide Siria, o we nwua n’anyasi: ọbara ebe ab͕aruru ya aru we b͕apu ba n’etiti ub͕ọ-ala-ya.

36 Iti-nkpu we gazue n’ọmuma-ulo-ikwū mb͕e anyanwu nāda, si, Nwoke ọ bula, ya la n’obodo-ya, nwoke ọ bula, ya la n’ala-ya.

37 Eze we nwua, ewe bubata ya na Sameria; ha we lìe eze na Sameria.

38 Ewe ṅachapu ub͕ọ-ala-ya n’akuku ọdọ-miri Sameria; nkita we racha ọbara-ya; (ma ndinyom nākwa iko sara aru-ha n’ebe ahu;) dika okwu Jehova si di nke O kwuru.

39 Ma okwu Ehab nile nke fọduru, na ihe nile ọ mere, na ulo ọdu nke o wuru, na obodo nile nke o wuru, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

40 Ehab we so nna-ya-hà dina n’ọnwu; Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n’ọnọdu ya.

41 Jehoshafat nwa Esa malitere ibu eze Juda n’arọ nke-anọ nke Ehab, bú eze Israel.

42 Jehoshafat b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise na Jerusalem. Aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi.

43 O jere ije n’uzọ Esa, bú nna-ya; o sighi nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n’anya Jehova: nání na ewezugaghi ebe di elu; ndi Israel nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe di elu nile.

44 Jehoshafat me-kwa-ra ka ya na eze Israel di n’udo.

45 Ma okwu Jehoshafat nile nke fọduru, na ihe idi-ike-ya nke o mere, na otú o buru agha, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

46 Ọzọ, ndi fọduru n’etiti ndi edoro nsọ ikwa iko, bú ndi fọduru n’ubọchi Esa nna-ya, o kpochapuru ha n’ala.

47 Ma eze adighi n’Edom: onye edoro onye-isi bu eze.

48 Jehoshafat mere ub͕ọ Tashish ijeru Ofia ibute ọla-edo: ma ha ejeghi; n’ihi na etiwara ub͕ọ ahu n’Ezion-geba.

49 Mb͕e ahu Ehazaia nwa Ehab siri Jehoshafat, Ka ndi-orùm soro ndi-orù-gi je n’ub͕ọ-gi. Ma Jehoshafat ekweghi.

50 Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Devid nna-ya: Jehoram nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

51 Ehazaia nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n’arọ nke-iri-na-asa nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze Israel arọ abua.

52 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, je kwa ije n’uzọ nna-ya, na n’uzọ nne-ya, na n’uzọ Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie.

53 O fè-kwa-ra Beal òfùfè, kpọ isi ala nye ya, we kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.