Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 11

1 Ma eze, bú Solomon, huru ọtutu ndinyom ala ọzọ n’anya, tiyere nwa-nwayi Fero, ndinyom Moab, ndinyom Amon, ndinyom Edom, ndinyom Zaidon, ndinyom Het;

2 bú ndi sitere na mba ndi Jehova siri umu Israel, Unu abala n’etiti ha, ndi ahu aba-kwa-la n’etiti unu: n’ezie ha gēwezuga obi-unu ka o so chi nile ha: ndi ahu ka Solomon rapara n’ihu-n’anya.

3 O we nwe nnù ndinyom na ọgu iri-na-ise, bú umu ndi-isi, na ọgu ndi-iko-nwayi iri-na-ise: ndinyom-ya we wezuga obi-ya.

4 O rue, na mb͕e agadi Solomon, na ndinyom-ya wezugara obi-ya ka o so chi ọzọ: obi-ya ezughi kwa okè n’ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya.

5 Solomon we jeso Ashtoret, bú chi ndi Zaidon, jeso kwa Milkom, bú ihe-árú ndi Amon.

6 Solomon we me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, o jesozughi kwa Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere.

7 Mb͕e ahu Solomon wubere ebe di elu nye Kemosh, bú ihe-árú Moab, n’ugwu nke di n’iru Jerusalem, nye kwa Molek, bú ihe-árú umu Amon.

8 Otú a ka o me-kwa-ra ndinyom-ya nile, bú ndi ala ọzọ, ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāchu-kwa-ra chi nile ha àjà.

9 Jehova we wesa Solomon iwe, n’ihi na ewezugara obi-ya n’ebe Jehova nọ, bú Chineke Israel, Onye mere ka ọ hu Ya anya ub͕ò abua,

10 Onye nye-kwa-ra ya iwu bayere ihe a, ka ọ ghara ijeso chi ọzọ: ma o debeghi ihe ahu nke Jehova nyere n’iwu.

11 Jehova we si Solomon, N’ihi na nka di n’aka-gi, i we ghara idebe ọb͕ub͕a-ndum na ukpurum nile, nke M’nyeworo gi n’iwu, aghaghm idọwapu ala-eze n’aru gi, nye orù-gi.

12 Ọ bu nání na ọ bughi n’ubọchi-gi ka M’gēme ya, n’ihi Devid, bú nna-gi: ọ bu n’aka nwa-gi ka M’gādọwapu ya.

13 Otú ọ di, ọ bughi ala-eze-gi nile ka M’gādọwapu; otù ebo ka M’gēnye nwa-gi, n’ihi Devid, bú orùm, na n’ihi Jerusalem, nke M’rọputaworo.

14 Jehova we me ka onye-nmegide biliere Solomon, bú Hedad, onye Edom: na nkpuru eze n’Edom ka o sitere.

15 O rue, mb͕e Devid nọ n’Edom, mb͕e Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, rigoro ilì ndi eb͕uru eb͕u, na o tib͕uru nwoke ọ bula n’Edom;

16 (n’ihi na ọnwa isi ka Joab na Israel nile nọduru n’ebe ahu, rue mb͕e o bipusiri nwoke ọ bula n’Edom;)

17 Hedad we b͕alaga, ya onwe-ya na ndikom Edom ufọdu n’etiti ndi-orù nna-ya tiyere ya, ibà n’Ijipt; ma Hedad bu nwa-okoro ntà.

18 Ha we si na Midian bilie, biarue Peran: ha we si na Peran chiri ndikom tiyere onwe-ha, bata n’Ijipt, biakute Fero, bú eze Ijipt; o we nye ya ulo, si ka enye ya nri, o nye-kwa-ra ya ala.

19 Hedad we huta amara n’iru Fero nke-uku, o we nye ya nwa-nne nwunye-ya na nwunye, bú nwa-nne Tahpenes nwunye eze.

20 Nwa-nne Tahpenes we muara ya Genubat, bú nwa-ya nwoke, onye Tahpenes mere ka ọ rapu ara n’etiti ulo Fero: Genubat we nọ n’ulo Fero n’etiti umu-ndikom Fero.

21 Ma Hedad nuru n’Ijipt na Devid soro nna-ya-hà dina n’ọnwu, na Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, anwuwo kwa, Hedad we si Fero, Zilagam, ka m’we la n’alam.

22 Fero we si ya, Ma gini nākọ gi onwe-gi n’ebe m’nọ, na, le, i nācho ila n’ala-gi? Ọ si, Ọ dighi ihe kọrọm: otú ọ di, zilagam nọ̄.

23 Chineke we me ka onye-nmegide ọzọ biliere ya, bú Rezon nwa Eliada, onye b͕anariri Hedadeza eze Zoba, bú onye-nwe-ya:

24 ọ chikọta ndikom n’ebe ọ nọ, ghọ onye-isi usu ndi nāpunara madu ihe, mb͕e Devid buru ndi Zoba: ha we jerue Damaskọs, biri nime ya, buru eze na Damaskọs.

25 Ọ we ghọrọ Israel onye-nmegide ubọchi nile nke Solomon, tiyere ihe ọjọ nke Hedad mere: ike Israel we gwusia ya, o we buru eze Siria.

26 Ma Jeroboam nwa Nebat, onye Efrata nke Zerida, bu orù Solomon nwere, aha nne-ya bu Zerua, nwayi di-ya nwuru, o weli-kwa-ra aka-ya megide eze.

27 Ma nka bu ihe kpatara o ji welie aka-ya megide eze: Solomon wuru Milo, mechie ntipú obodo Devid, bú nna-ya.

28 Nwoke ahu, bú Jeroboam, bu dike nke bu dìnkpà: Solomon we hu nwa-okorọbia ahu, na onye nēje ozi nke-ọma ka ọ bu, o we me ya ka ọ buru onye-nlekọta ibū nile nke ulo Josef.

29 O rue, na mb͕e ahu, na Jeroboam siri na Jerusalem pua, onye-amuma, bú Ahaija, bú onye Shailo, we chọta ya n’uzọ; ma Ahaija nēwere uwe ọhu yikwasi n’aru-ya; ha abua nọ kwa iche, nání ha, n’ọhia.

30 Ahaija we jide uwe ọhu ahu nke di n’aru ya, dọwa ya na ndọwa iri na abua.

31 Ọ si Jeroboam, Chiri n’onwe-gi ndọwa iri: n’ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M’nādọwapu ala-eze a n’aka Solomon, M’gēnye kwa gi ebo iri:

32 (ma ọ gēnwe otù ebo ahu, n’ihi orùm, bú Devid, na n’ihi Jerusalem, bú obodo nke M’rọputaworo n’ebo nile nke Israel:)

33 n’ihi na ha arapuwom, kpọ isi ala nye Ashtoret, bú chi ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú chi Moab, nye kwa Milkom, bú chi umu Amon; ha ejeghi kwa ije n’uzọm nile, ime ihe ziri ezi n’anyam, na idebe ukpurum nile na ikpém nile, dika Devid, bú nna-ya, mere.

34 Ma M’gaghi-ewepu ala-eze nile n’aka-ya: kama onye-isi ka M’gēdo ya ubọchi nile nke ndu-ya, n’ihi Devid, bú orùm, onye M’rọputara, n’ihi na ọ debere ihe nile M’nyere n’iwu na ukpurum nile:

35 ma M’gēwepu ala-eze n’aka nwa-ya, were ya nye gi, bú ebo iri.

36 Ma nwa-ya ka M’gēnye otù ebo, ka Devid, bú orùm, we nwe oriọna ubọchi nile n’irum na Jerusalem, bú obodo nke M’rọputaworo Onwem itiye aham n’ebe ahu.

37 Ma gi ka M’gēwere, i gābu kwa eze n’ihe nile nke nkpuru-obi-gi nāchọsi ike, i gābu kwa eze Israel.

38 O gēru kwa, ọ buru na i nu ihe nile M’gēnye gi n’iwu, ọ buru kwa na i je ije n’uzọm nile, me ihe ziri ezi n’anyam, idebe ukpurum nile na ihe nile M’nyere n’iwu, dika Devid, bú orùm, mere; na M’gānọyere gi, wu-kwa-ra gi ulo kwesiri ntukwasi-obi, dika M’wuru Devid, M’gēnye kwa gi Israel.

39 M’gēweda kwa nkpuru Devid n’ihi nka, ma ọ bughi ubọchi nile.

40 Solomon we chọ ime ka Jeroboam nwua: Jeroboam we bilie, b͕alaga n’Ijipt jekuru Shaishak, bú eze Ijipt, ọ we nọ n’Ijipt rue ọnwu Solomon.

41 Ma okwu Solomon nile nke fọduru, na ihe nile O mere, na amam-ihe-ya, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ okwu Solomon?

42 Ma ubọchi nile Solomon bu eze Israel nile nime Jerusalem di ọgu arọ abua.

43 Solomon we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’obodo Devid, bú nna-ya: Rehoboam, bú nwa-ya, we buru eze n’ọnọdu ya.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 12

1 Rehoboam we jerue Shekem: n’ihi na Shekem ka Israel nile biaruru, ime ya eze.

2 O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nānọ n’Ijipt rue mb͕e ahu, ebe o siri n’iru Solomon, bú eze, b͕alaga, Jeroboam we biri n’Ijipt,

3 ha we ziga, kpọ ya;) na Jeroboam na nkpọkọta Israel nile biara, we gwa Rehoboam okwu, si,

4 Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a gi onwe-gi me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè.

5 Ọ si ha, Lanu rue ubọchi atọ ọzọ, laghachikutekwam. Ndi Israel we la.

6 Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n’iru Solomon, bú nna-ya, mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu?

7 Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka orù ta, we fè ha òfùfè, za ha, gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile.

8 Ma ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, o me ka umu-okorọbia dua ya ọdu, bú ndi ya na ha tokọzuru okè, ndi nēguzo n’iru ya.

9 Ọ si ha, Gini ka unu onwe-unu nādu ọdu, ka ayi we weghachiri ndi nka okwu, bú ndi gwaworom okwu, si, Me ka ọ di nfe kari, bú yoke nke nna-gi tukwasiri ayi?

10 Umu-okorọbia ndi ya na ha tokọzuru okè we gwa ya okwu, si, Otú a ka i gāsi ndi nka, ndi gwara gi okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka ọ di arọ́, ma gi onwe-gi me ka ọ di ayi nfe kari; otú a ka i gāgwa ha, si, Nkpisi-aka nke-ntà nkem di okpotokpo kari úkwù nnam.

11 Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

12 Jeroboam na ndi Israel nile we biakute Rehoboam n’ubọchi nke-atọ, dika eze kwuru, si, Laghachikutem n’ubọchi nke-atọ.

13 Eze we za ndi ahu okwu ike, rapu idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya;

14 o we gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

15 Eze we ghara ige ndi Israel nti; n’ihi na nchighari nka sitere n’aka Jehova, ka O we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Jehova gwara Jeroboam nwa Nebat site n’aka Ahaija onye Shailo.

16 Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jese: lanu n’ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel we la n’ulo-ikwū-ha.

17 Ma umu Israel ndi bi n’obodo nile nke Juda, Rehoboam we buru eze-ha.

18 Eze, bú Rehoboam, we ziga Adoram, onye bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè; Israel nile we were nkume tub͕ue ya, o we nwua. Eze, bú Rehoboam, we b͕a onwe-ya ume irigo n’ub͕ọ-ala-ya, ib͕alaga na Jerusalem.

19 Israel we jehie megide ulo Devid, rue ta.

20 O rue, mb͕e Israel nile nuru na Jeroboam alatawo, ha we zìe kpọ ya ibia na nzukọ-ha, ha we me ya eze Israel nile: ọ dighi ebo ọ bula soro ulo Devid, ma-ọbughi ebo Juda, nání ya.

21 Rehoboam we biarue Jerusalem, kpọkọta ulo Juda nile, na ebo Benjamin, orú nnù ndikom orú uzọ na abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nēbu agha, ibuso ulo Israel agha, iweghachiri Rehoboam nwa Solomon ala-eze.

22 Okwu Chineke we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si,

23 Gwa Rehoboam nwa Solomon, bú eze Juda, gwa kwa ulo nile nke Juda na Benjamin, gwa kwa ndi Israel fọduru, okwu, si,

24 Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu, bú umu Israel, agha: laghachinu, nwoke ọ bula n’ulo-ya; n’ihi na n’ebe M’nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, laghachi azu n’ulo-ha, dika okwu Jehova si di.

25 Jeroboam we wue Shekem n’ugwu Efraim, biri n’ebe ahu; o si n’ebe ahu pua, wue Penuel.

26 Jeroboam we si n’obi-ya, Ub͕u a ka ala-eze gālaghachikuru ulo Devid:

27 ọ buru na ndi nka arigo ichu àjà n’ulo Jehova na Jerusalem, obi ndi nka gālaghachikuru kwa onye-nwe-ha, bú Rehoboam eze Juda; ha gēb͕ukwam, laghachikuru Rehoboam, bú eze Juda.

28 Eze we me ka adua ya ọdu, o we me umu-ehi abua nke ọla-edo; ọ si ha, Unu arigozuwo Jerusalem; le chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n’ala Ijipt rigoputa.

29 Ọ dọba otù nime Bet-el, tiye nke-ọzọ nime Dan.

30 Ihe a we ghọ nmehie: ndi Israel we je n’iru otù nime ha, rue Dan.

31 O me ulo nke ebe di elu, me kwa ndi-nchu-àjà sitere n’ọnu-ọgugu ndi Israel nile, ndi nēsiteghi n’umu Livai.

32 Jeroboam we me ememe n’ọnwa nke-asatọ, n’ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu, dika ememe nke di na Juda, o we rigorue ebe-ichu-àjà ahu; otú a ka o mere na Bet-el, ichuru umu-ehi ahu, bú nke o mere, àjà: o guzo na Bet-el ndi-nchu-àjà nke ebe di elu nke o mere.

33 Ọ rigorue ebe-ichu-àjà nke o mere na Bet-el n’ubọchi nke-iri-na-ise n’ọnwa nke-asatọ, bú n’ọnwa nke ọ chèputara n’obi-ya: o we mere umu Israel ememe, rigorue ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 13

1 Ma, le, onye nke Chineke siri na Juda bia n’okwu Jehova rue Bet-el: ma Jeroboam nēguzo n’akuku ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

2 O we kpọ òkù megide ebe-ichu-àjà ahu n’okwu Jehova, si, Ebe-ichu-àjà, ebe-ichu-àjà, otú a ka Jehova siri: Le, agāmuru ulo Devid otù nwa-nwoke, Josaia bu aha-ya; ọ gāchu kwa n’elu gi ndi-nchu-àjà nke ebe di elu ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’elu gi, ọkpukpu madu ka ha gēsure kwa ọku n’elu gi.

3 O nye-kwa-ra ihe-iriba-ama n’ubọchi ahu, si, Nka bu ihe-iriba-ama ahu nke Jehova kwuworo: Le, agāb͕awa ebe-ichu-àjà nka, wusi kwa ntu nke di n’elu ya.

4 O rue, mb͕e eze nuru okwu onye nke Chineke ahu, nke ọ kpọrọ megide ebe-ichu-àjà nime Bet-el, na Jeroboam siri n’ebe-ichu-àjà setipu aka-ya, si, Jidenu ya. Aka-ya, nke o setiri imegide ya, we kpọnwua, ọ pughi kwa iseghachi ya n’aru ya.

5 Ab͕awa-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu, ewe si n’ebe-ichu-àjà wusi ntu, dika ihe-iriba-ama si di nke onye nke Chineke nyere n’okwu Jehova.

6 Eze we za, si onye nke Chineke, Biko, chọ ime ka iru Jehova, bú Chineke-gi, dajua, gi kpe kwa ekpere bayerem, ka akam we laghachikutem. Onye nke Chineke ahu we chọ ka iru Jehova dajua, aka eze we laghachikuru ya, we di ka ọ di na mbu.

7 Eze we si onye nke Chineke ahu, Sorom ba n’ulo, b͕a onwe-gi ume, m’gēnye kwa gi onyinye.

8 Onye nke Chineke ahu we si eze, Ọ buru na i nyem nkera ulo-gi, m’gaghi-esoro gi ba, m’gaghi-eri kwa nri, m’gaghi-aṅu kwa miri n’ebe a:

9 n’ihi na otú a ka enyerem iwu n’okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, alaghachi-kwa-la n’uzọ i siri je.

10 O we la n’uzọ ọzọ, ọ laghachighi kwa n’uzọ o siri biaru Bet-el.

11 Ma otù onye-amuma, bú agadi, bi na Bet-el; nwa-ya we bia, kọrọ ya akukọ omume nile nke onye nke Chineke mere ubọchi ahu na Bet-el: okwu nile ọ gwara eze, ha we kọrọ nna-ha akukọ okwu ahu.

12 Nna-ha we gwa ha okwu, si, Òle nke bu uzọ o jere? Ma umu-ya ndikom ahuwo uzọ nke onye nke Chineke ahu jere, bú onye siri na Juda bia.

13 O we si umu-ya, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwara ya inyinya-ibu: ọ nọkwasi n’elu ya.

14 O we jeso onye nke Chineke ahu n’azu, chọta ya ka ọ nānọdu n’okpuru osisi terebinth: ọ si ya, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye Chineke ahu nke siri na Juda bia? Ọ si, Ọ bu mu onwem.

15 Ọ si ya, Sorom je n’ulo, ri kwa nri.

16 Ọ si, Apughm isoro gi laghachi, ma-ọbu isoro gi ba n’ulo: m’gaghi-esoro kwa gi ri nri ma-ọbu iṅu miri n’ebe a:

17 n’ihi na okwu rurum nti n’okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, n’ebe ahu, alaghachi-kwa-la ila n’uzọ ahu i jere nime ya.

18 Ọ si ya, Mu onwem bu kwa onye-amuma dika gi; mọ-ozi we gwam okwu n’okwu Jehova, si, Me ka o soro gi lata n’ulo-gi, ka o we rie nri ṅu kwa miri. Ma ọ gwara ya okwu-ugha.

19 O we soro ya laghachi, rie nri n’ulo-ya, ṅu kwa miri.

20 O rue, mb͕e ha abua nānọdu nēri ihe na table, na okwu Jehova ruru onye-amuma ahu nti, bú onye mere ka ọ laghachi:

21 ọ kpọ onye nke Chineke ahu òkù, bú onye siri na Juda bia, si, Otú a ka Jehova siri, N’ihi na i nupuwo isi n’okwu-ọnu Jehova, i we ghara idebe ihe enyere n’iwu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n’iwu,

22 i we laghachi, rie nri, ṅua miri, n’ebe nke Ọ gwara gi okwu, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri; ozu-gi agaghi-abiaru ílì nna-gi-hà.

23 O rue, mb͕e o risiri nri, mb͕e ọ ṅusi-kwa-ra ihe-ọṅuṅu, na o were inyinya-ibu jikwara ya, bú onye-amuma ahu nke o mere ka ọ laghachi.

24 Ọ we la, ọdum we huta ya n’uzọ, me ka ọ nwua: ewe tupu ozu-ya n’uzọ, inyinya-ibu-ya nēguzo kwa n’akuku ya; ọdum ahu nēguzo kwa n’akuku ozu ahu.

25 Ma, le, ndikom nāgabiga, ha we hu ozu, ka atupuru ya n’uzọ, hu kwa ọdum, ka o nēguzo n’akuku ozu ahu: ha we bia, kwue ya n’obodo nke onye-amuma ahu, bú agadi, nēbi nime ya.

26 Onye-amuma ahu nke mere ka o si n’uzọ laghachi we nu ya, ọ si, Onye nke Chineke ahu ka ọ bu, bú onye nupuru isi n’okwu-ọnu Jehova: Jehova we were ya nye ọdum, o we dọb͕ue ya, me ka ọ nwua, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara ya.

27 O we gwa umu-ya okwu, si, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwa ya.

28 O je chọta ozu-ya, ka atupuru ya n’uzọ, na inyinya-ibu na ọdum, ka ha nēguzo n’akuku ozu ahu: ọdum erighi ozu ahu, ọ dọb͕ughi kwa inyinya-ibu ahu.

29 Onye-amuma ahu we bulie ozu onye nke Chineke ahu, dọba ya n’elu inyinya-ibu ahu, bughachi ya: ọ biarue obodo onye-amuma ahu, bú agadi, iti aka n’obi, na ilì ya.

30 Ọ dọba ozu-ya n’ílì-ya; ha we tiere ya aka n’obi, si, Ewó, nwa-nnem!

31 O rue, mb͕e o lìsiri ya na ọ gwara umu-ya okwu, si, Mb͕e m’nwuru, lì-kwa-num n’ílì nke elìri onye nke Chineke; dọba ọkpukpum n’akuku ọkpukpu-ya.

32 N’ihi na okwu ahu aghaghi irè, bú nke ọ kpọrọ òkù n’okwu Jehova megide ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, megide kwa ulo nile nke ebe di elu nke di n’obodo nile nke Sameria.

33 Mb͕e ihe a gasiri, Jeroboam esighi n’uzọ ọjọ ya laghachi, ma o me-kwa-ra ndi-nchu-àjà nke ebe di elu ọzọ site n’ọnu-ọgugu nile nke ndi Israel: onye ihe-ya nātọ ya utọ, o mejue ya aka, o we ghọ otù nime ndi-nchu-àjà nke ebe di elu.

34 Ihe a we ghọrọ ulo Jeroboam nmehie, ọbuná izopu ya, na ikpochapu ya n’elu uwa.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 14

1 Na mb͕e ahu Abaija nwa Jeroboam riara ọria.

2 Jeroboam we si nwunye-ya, Biko, bilie, nwogharia onwe-gi, ka aghara imara na gi onwe-gi bu nwunye Jeroboam: i gēje kwa Shailo; le, n’ebe ahu ka Ahaija, bú onye-amuma, nọ; onye ahu kwuru okwu bayerem na m’gābu eze ndi nka.

3 Chiri kwa n’aka-gi ob͕e achicha iri, na achicha ntà, na karama manu-aṅu, jekuru ya: onye ahu gēgosi gi ihe gēme nwa-okoro.

4 Nwunye Jeroboam we me otú a, we bilie, je Shailo, ba n’ulo Ahaija. Ma Ahaija apughi ihu uzọ; n’ihi na anya-ya guzoro eguzo n’ihi agadi-ya.

5 Ma Jehova siri Ahaija, Le, nwunye Jeroboam nābia iju ase bayere nwa-ya nwoke n’aka-gi; n’ihi na ọ nāria ọria: otú a na ọtú a ka i gāgwa ya: ọ gēru kwa, mb͕e ọ batara, na nwayi ahu ganēme onwe-ya dika onye ala ọzọ.

6 O rue, mb͕e Ahaija nuru olu ukwu-ya ka ha nāzọ, mb͕e ọ nābata n’ọnu-uzọ, na ọ siri, Bata, nwunye Jeroboam; n’ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nēme onwe-gi dika onye ala ọzọ? ma mu onwem bu onye-ozi siri ike n’ebe i nọ.

7 Je, si Jeroboam, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: N’ihi na esim n’etiti ndim welie gi elu, me gi onye-ndú ndim, bú Israel,

8 we dowapu ala-eze n’ulo Devid, nye gi ya: ma i dighi ka orùm, bú Devid, onye debere ihe nile M’nyere n’iwu, o were obi-ya nile jesom, ime nání ihe ziri ezi n’anyam;

9 ma i mewo ihe ọjọ kari ndi nile buru gi uzọ, i we je mere onwe-gi chi ọzọ di iche iche, na arusi a kpuru akpu, ikpasum iwe, i we tufuem n’azu gi:

10 n’ihi nka, le, M’nēme ka ihe ọjọ biakute ulo Jeroboam, M’gēbipu kwa n’aru Jeroboam nwa-nwoke ọ bula, onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n’Israel, M’gēkpochapu kwa nke fọduru nke ulo Jeroboam, dika madu si ekpochapu ǹsí-anu, rue mb͕e agēkpochapuzu ya.

11 Onye nke Jeroboam nke nwuru anwu n’obodo, nkita gēri ya; onye nke nwuru anwu n’ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya: n’ihi na Jehova ekwuwo ya.

12 Ma gi onwe-gi bilie, la n’ulo-gi: mb͕e ukwu-gi nābà n’obodo, nwata ahu gānwu kwa.

13 Ma Israel nile gētiri ya aka n’obi, lìe ya; n’ihi na onye a, nání ya, nime ndi Jeroboam nwere gābiaru ílì: n’ihi na ahuru nime ya ezi ihe n’ebe Jehova, bú Chineke Israel, nọ, n’ulo Jeroboam.

14 Jehova gēme kwa ka otù eze Israel biliere Ya, onye gēbipu ulo Jeroboam ubọchi a: ma gini? ọbuná ub͕u a.

15 Jehova gētib͕u kwa Israel, dika amì nēme nkpatu nime miri; Ọ gēropu kwa Israel n’ezi ala nka, nke O nyere ndi bu nna-ha, Ọ gēfesa kwa ha n’ofè Osimiri; n’ihi na ha emewo Asherim-ha, nākpasu Jehova iwe.

16 Ọ gārara kwa Israel nye n’ihi nmehie Jeroboam nile, nke o mehieworo, na nke o ji me ka Israel mehie.

17 Nwunye Jeroboam we bilie, la, biarue Tiaza: mb͕e nwayi ahu nābata na nbata-uzọ ulo, nwa-okoro ahu we nwua.

18 Israel nile we lìe ya, tiere ya aka n’obi; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n’aka orù-Ya, bú Ahaija onye-amuma.

19 Ma ihe nile nke fọduru nke Jeroboam mere, ka o si bu agha, na ka o si buru eze, le, edewo ha n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel.

20 Ubọchi nke Jeroboam buru eze we di orú arọ na abua: o we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, Nedab, bú nwa-ya, we buru eze n’ọnọdu ya.

21 Ma Rehoboam, bú nwa Solomon, bu eze na juda. Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na asa nime Jerusalem, bú obodo nke Jehova rọputara n’etiti ebo nile nke Israel, itiye aha-Ya n’ebe ahu. Aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon.

22 Juda we me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova; ha we were nmehie-ha nile nke ha mehiere kpasue Ya ekworo, kari ihe nile ndi bu nna-ha mere.

23 Ha onwe-ha we wu-kwa-ra onwe-ha ebe di elu, na ogidi, na Asherim, n’elu ugwu ọ bula di elu, na n’okpuru osisi ndu ọ bula;

24 Ọzọ kwa, ndi edoro nsọ ikwa iko di n’ala: ha mere dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n’iru umu Israel.

25 O rue, n’arọ nke-ise nke eze Rehoboam, na Shaishak, bú eze Ijipt, rigotara imegide Jerusalem:

26 o wepu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze; ọbuná ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere.

27 Eze, bú Rehoboam, we me ọta ọla n’ọnọdu ha, nye ha n’aka ndi-isi ndi-ọb͕a-ọsọ, bú ndi nēche ọnu-uzọ ulo eze, ka ha lekọta ha anya.

28 O rue, mb͕e ọ bula eze nābà n’ulo Jehova, na ndi-ọb͕a-ọsọ nēbu ha, we bughachi ha n’ime-ulo ndi-ọb͕a-ọsọ.

29 Ma okwu Rehoboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda?

30 Ma agha di n’etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile.

31 Rehoboam we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Devid: aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon. Abaijam nwa-ya we buru eze n’ọnọdu-ya.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 15

1 Ma n’arọ nke-iri-na-asatọ nke eze, bú Jeroboam nwa Nebat, ka Abaijam malitere ibu eze Juda.

2 Arọ atọ ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Meaka nwa-nwayi Abishalom.

3 Ọ nējeghari na nmehie nile nke nna-ya, nke o buru ya uzọ me: obi-ya ezughi kwa okè n’ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya.

4 Ma n’ihi Devid ka Jehova, bú Chineke-ya, nyere ya oriọna na Jerusalem, ime ka nwa-ya bilie n’ọnọdu ya, na ime ka Jerusalem guzo:

5 n’ihi na Devid mere ihe ziri ezi n’anya Jehova, o sighi kwa n’ihe ọ bula O nyere ya n’iwu wezuga onwe-ya ubọchi nile nke ndu-ya, ọ bu nání n’okwu Uraia onye Het.

6 Ma agha di n’etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile nke ndu-ya.

7 Ma okwu Abaijam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda? Ma agha di n’etiti Abaijam na Jeroboam.

8 Abaijam we so nna-ya-hà dina n’ọnwu; ha we lìe ya n’obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

9 Ma n’arọ nke-orú nke Jeroboam eze Israel ka Esa malitere ibu eze Juda.

10 Ọgu arọ abua na otù ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Meaka nwa-nwayi Abishalom.

11 Esa mere ihe ziri ezi n’anya Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere.

12 O we me ka ndi edoro nsọ ikwa iko si n’ala-ya gabiga, o wezuga-kwa-ra arusi nile nke nna-ya-hà mere.

13 Ọzọ kwa, Meaka, bú nne-ya, o wezuga-kwa-ra ya n’ibu eze-nwayi, n’ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, o sure ya ọku na miri-iyi Kidron.

14 Ma ewezugaghi ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n’ebe Jehova nọ ubọchi-ya nile.

15 Ọ chibata n’ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ.

16 Ma agha di n’etiti Esa na Beasha, bú eze Israel, ubọchi-ha nile.

17 Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata.

18 Esa we chiri ọla-ọcha nile na ọla-edo nile nke fọduru n’àkù ulo Jehova, na àkù ulo eze nile, nye ha n’aka ndi-orù-ya: eze, bú Esa, we ziga ha jekuru Ben-hedad, nwa Tab-rimon, nwa Hezion, bú eze Siria, nke bi na Damaskọs, si,

19 Ọb͕ub͕a-ndu di n’etiti mu na gi, na n’etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom gi onyinye, bú ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n’arum rigo.

20 Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel, o we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-bet-meaka, na Kinerot nile, tiyere ala nile nke Naftali.

21 O rue, mb͕e Beasha nuru ya, na ọ rapuru iwu Rema, we biri na Tiaza.

22 Ma eze, bú Esa, mere ka Juda nile nu; ọ dighi onye puru ya: ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; eze, bú Esa, we were ha wue Geba Benjamin na Mizpa.

23 Ma okwu Esa nile nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na ihe nile o mere, na obodo nile o wuru, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Juda? Nání na ọ riara ọria n’ukwu-ya abua na mb͕e agadi-ya.

24 Esa we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Devid, bú nna-ya: Jehoshafat nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

25 Ma Nedab, bú nwa Jeroboam, malitere ibu eze Israel n’arọ nke-abua nke Esa, bú eze Juda, ọ we buru eze Israel arọ abua.

26 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, je ije n’uzọ nna-ya, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.

27 Beasha, bú nwa Ahaija, nke ulo Isaka, we kekọta madu imegide ya; Beasha we tib͕ue ya na Gibeton, nke diri ndi Filistia; n’ihi na Nedab na Israel nile nānọchigide Gibeton n’agha.

28 Beasha we me ka ọ nwua n’arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n’ọnọdu ya.

29 O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, na o tib͕uru ulo Jeroboam nile; o kweghi ka onye ọ bula nke nēku ume fọduru Jeroboam, rue mb͕e o kpochapuru ya; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n’aka orù-Ya, bú Ahaija onye Shailo:

30 n’ihi nmehie nile nke Jeroboam nke o mehiere, na nke o ji me ka Israel mehie; nime nkpasu-iwe-ya nke o ji kpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe.

31 Ma okwu Nedab nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

32 Ma agha di n’etiti Esa na Beasha, bú eze Israel, ubọchi-ha nile.

33 N’arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, ka Beasha, bú nwa Ahaija, malitere ibu eze Israel nile nime Tiaza, orú arọ na anọ.

34 O me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, je ije n’uzọ Jeroboam, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 16

1 Okwu Jehova we rue Jihu, bú nwa Hanani, nti, imegide Beasha, si,

2 N’ihi na esim n’ájá welie gi elu, me gi onye-ndú ndim, bú Israel; i we je ije n’uzọ Jeroboam, me ndim, bú Israel, ka ha mehie, iwere nmehie nile ha kpasuem iwe;

3 le, M’nēkpochapu nke fọduru nke Beasha, bú nke fọduru nke ulo-ya; M’gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam, bú nwa Nebat.

4 Onye nke Beasha nke nwuru anwu n’obodo, nkita gēri ya; onye nke ya nke nwuru anwu n’ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya.

5 Ma okwu Beasha nile nke fọduru, na ihe o mere, na idi-ike-ya, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

6 Beasha we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya na Tiaza; Ila, bú nwa-ya, we buru eze n’ọnọdu ya.

7 Ọzọ kwa, n’aka Jihu, bú nwa Hanani, onye-amuma, ka okwu Jehova biara imegide Beasha, na imegide ulo-ya, ma n’ihi ihe ọjọ nile nke o mere n’anya Jehova, iwere omume aka-ya kpasue Ya iwe, n’idi ka ulo Jeroboam; ma n’ihi na o tib͕uru ya.

8 N’arọ nke-orú-na-isi nke Esa, bú eze Juda, ka Ila nwa Beasha malitere ibu eze Israel nime Tiaza, arọ abua.

9 Orù-ya Zimri, bú onye-isi nkera ub͕ọ-ala-ya, we kekọta madu imegide ya: ma ya onwe-ya nọ na Tiaza, nāṅu manya nāṅubiga ya okè n’ulo Aza, onye bu onye-isi ulo-ya na Tiaza:

10 Zimri we ba, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, n’arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n’ọnọdu ya.

11 O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, mb͕e ọ nọkwasiri n’oche-eze-ya, na o tib͕uru ulo Beasha nile: o kweghi ka otù nwa-nwoke fọduru ya, ma ọ bu nime ndi-ikwu-ya, ma-ọbu nime ndi-eyì-ya.

12 Zimri we kpochapu ulo Beasha nile, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru megide Beasha n’aka Jihu, bú onye-amuma,

13 bayere nmehie nile nke Beasha, na nmehie nile nke Ila, bú nwa-ya, nke ha mehiere, na nke ha ji me Israel mehie, iwere ihe-efu nile ha kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe.

14 Ma okwu Ila nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

15 N’arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, ka Zimri bu eze ubọchi asa na Tiaza. Ma ndi Israel nọ n’ọmuma-ulo-ikwū imegide Gibeton, nke diri ndi Filistia.

16 Ndi nọ n’ọmuma-ulo-ikwū we nu, si, Zimri ekekọtawo madu, ọzọ kwa, o tib͕uwo eze: Israel nile we me Ọmri, bú onye-isi usu-ndi-agha, ka ọ buru eze Israel n’ubọchi ahu n’ọmuma-ulo-ikwū.

17 Ọmri we si na Gibeton rigo, ya na Israel nile, ha we nọchigide Tiaza n’agha.

18 O rue, mb͕e Zimri huru na ewerewo obodo, na ọ bara n’ulo-elu nke ulo eze, sure ulo eze n’ọku n’isi onwe-ya, nwua,

19 n’ihi nmehie-ya nile nke ọ mehiere, n’ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, n’ije ije n’uzọ Jeroboam, na nime nmehie nke o mere, ime ka Israel mehie.

20 Ma okwu Zimri nile nke fọduru, na nkekọta nke ọ kekọtara madu imegide eze, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

21 Mb͕e ahu ekewara ndi Israel na nkera abua: otù nkera ndi Israel soro Tibni, bú nwa Ginat, ime ya ka ọ buru eze; nkera ọzọ soro Ọmri.

22 Ndi soro Ọmri we di ike kari ndi soro Tibni, bú nwa Ginat: Tibni we nwua, Ọmri we buru eze.

23 N’arọ nke-orú-na-iri-na-otù nke Esa, bú eze Juda, ka Ọmri malitere ibu eze Israel, arọ iri na abua: ọ bu eze na Tiaza arọ isi.

24 Ọ zuru ugwu Sameria n’aka Shema na talent ọla-ọcha abua; o wue ulo n’ugwu ahu, kpọ aha obodo ahu o wuru Sameria, n’aha Shema, bú onye-nwe ugwu ahu.

25 Ọmri mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, me kwa ihe ọjọ kari ndi nile buru ya uzọ.

26 Ọ je ije n’uzọ nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na nime nmehie-ya nile nke o jiri me ka Israel mehie, iwere ihe-efu nile ha kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe.

27 Ma ihe Ọmri nile nke fọduru, bú nke o mere, na ihe idi-ike-ya nke o mere, èdeghi ihe ahu n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Israel?

28 Ọmri we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya na Sameria: Ehab, bú nwa-ya, we buru eze n’ọnọdu ya.

29 Ma n’arọ nke-orú-na-iri-na-asatọ nke Esa, bú eze Juda, ka Ehab, bú nwa Ọmri, malitere ibu eze Israel: Ehab nwa Ọmri we buru eze Israel nime Sameria orú arọ na abua.

30 Ehab nwa Ọmri mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova kari ndi nile buru ya uzọ.

31 O rue, dika agāsi na ọ bu ihe nfe na ọ nējeghari na nmehie nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na ọ luru Jezebel na nwunye, bú nwa-nwayi Etbeal eze ndi Zaidon, ọ we je fè Beal òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ya.

32 O we me ka ebe-ichu-àjà guzoro Beal n’ulo Beal, nke o wuru na Sameria.

33 Ehab me-kwa-ra Ashera; Ehab we me ihe ọzọ ikpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe, kari ndi-eze nile nke Israel ndi buru ya uzọ.

34 N’ubọchi-ya ka Hiel, bú onye Bet-el, wuru Jeriko: Abairam, bú ọkpara-ya, ka o were tọ ntọ-ala-ya; Segub, bú nwa-ya nwoke nke-ntà ka ọ were kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n’aka Joshua nwa Nun.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 17

1 Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m’guzoworo n’iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n’arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di.

2 Okwu Jehova we rue ya nti, si,

3 Si n’ebe a pua, chere onwe-gi iru n’Iru-anyanwu, zo onwe-gi na miri-iyi Kerit, nke di n’iru Jọdan.

4 O gēru kwa, na i gāṅu miri sitere na miri-iyi ahu; ọ bu kwa ugolo-ọma ka M’nyeworo iwu izù gi n’ebe ahu.

5 O we je, me dika okwu Jehova si di: o je biri na miri-iyi Kerit, nke di n’iru Jọdan.

6 Ugolo-ọma we nēbutere ya achicha na anu n’ututu, na achicha na anu n’anyasi; ọ nāṅu kwa miri sitere na miri-iyi ahu.

7 O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na miri-iyi ahu takọrọ, n’ihi na miri-ozuzo adighi n’ala.

8 Okwu Jehova we rue ya nti, si,

9 Bilie, je Zarefat, nke diri Zaidon, biri n’ebe ahu: le, enyewom otù nwayi di-ya nwuru nọ n’ebe ahu iwu izù gi.

10 O we bilie, je Zarefat, biarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, ma, le, n’ebe ahu ka nwayi di-ya nwuru nọ nāchikọta nkú: o we kpọ ya òkù, si, Biko, kuterem nwantī miri n’ihe, ka m’we ṅua.

11 O we je ikute ya, Elaija we kpọ ya òkù, si, Biko, wetaram iberibe achicha n’aka-gi.

12 Nwayi ahu we si, Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, Ọ dighi ob͕e achicha m’nwere ma-ọli, ma nání otù nju-aka utu ọka n’okpokoro, na nwantī manu n’ite: ma, le, anamachikọta nkú abua, ka m’we ba, were ya doziere onwem, dozi-kwa-ra nwam nwoke, ka ayi we rie ya, nwua.

13 Elaija we si ya, Atula egwu; ba, mere dika okwu-gi si di: nání buru uzọ merem ob͕e achicha ntà site na ya, weputaram ya, ma mere onwe-gi, me-kwa-ra nwa-gi nwoke, n’ikpe-azu.

14 N’ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Okpokoro utu ọka ahu agaghi-agwu, ite manu ahu agaghi-akọ gi kwa, rue ubọchi Jehova gēnye miri-ozuzo n’elu uwa.

15 O we je me dika okwu Elaija si di: nwayi ahu we rie, ya onwe-ya, na Elaija, na ulo-ya, ọtutu ubọchi.

16 Okpokoro utu ọka ahu agwughi, ite manu ahu akọghi kwa, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n’aka Elaija.

17 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwa nke nwayi ahu, bú nwayi nwe ulo, riara ọria; ọria-ya we di ike nke-uku, rue mb͕e ume nāfọdughi nime ya.

18 Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?

19 Ọ si ya, Nyem nwa-gi nwoke. O we kuputa ya n’obi-ya, kugo ya n’ime-ulo-elu, ebe ya onwe-ya nānọdu, ọ tọb͕ọ ya n’ihe-ndina-ya.

20 Ọ kpọkue Jehova, si, Jehova, bú Chinekem, ọ̀ bu kwa nwayi a di-ya nwuru, nke mu onwem nānọ n’ulo-ya dika ọbìa, ka I mejọworo, n’ime ka nwa-ya nwoke nwua?

21 O setia onwe-ya n’aru nwata ahu ub͕ò atọ, kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, bú Chinekem, ka nkpuru-obi nwata nka biaghachi nime ya.

22 Jehova we ge nti olu Elaija; nkpuru-obi nwata ahu we biaghachi nime ya, ọ we di ndu.

23 Elaija we kuru nwata ahu, si n’ime-ulo-elu ahu kudata ya n’ulo, nye ya nne-ya: Elaija we si, Le, nwa-gi nādi ndu.

24 Nwayi ahu we si Elaija, Ub͕u a amawom nka na onye nke Chineke ka i bu, na okwu Jehova bu kwa ezi-okwu n’ọnu-gi.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 18

1 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na okwu Jehova ruru Elaija nti, n’arọ nke-atọ, si, Je, me ka Ehab hu gi anya; M’gēnye kwa miri-ozuzo n’elu uwa.

2 Elaija we je ime ka Ehab hu ya anya. Ma oké unwu ahu siri ike na Sameria.

3 Ehab we kpọ Obadaia, onye bu onye-isi ulo-ya. (Ma Obadaia nātu egwu Jehova nke-uku:

4 o we rue, mb͕e Jezebel bipuru ndi-amuma Jehova, na Obadaia chiri ọgu ndi-amuma ise, zo ha, ọgu ndikom abua na iri n’otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha.)

5 Ehab we si Obadaia, Jegharia n’ala, rue isi-iyi nile nke miri, ru kwa miri-iyi nile: eleghi anya ayi gāchọta ahihia, we me ka inyinya na inyinya mule di ndu, ka ayi we ghara ibipu anu n’anu-ulo-ayi.

6 Ha we kewara onwe-ha ala ahu igabiga nime ya: Ehab jere n’otù uzọ, nání ya, Obadaia je-kwa-ra n’uzọ ọzọ, nání ya.

7 Obadaia we nọ n’uzọ, ma, le, Elaija zutere ya: ọ mata ya, da kpue iru-ya n’ala, si, Ọ̀ bu gi bu nka, onye-nwem Elaija?

8 Ọ si ya, Mu ka ọ bu: je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.

9 Ọ si, Gini ka m’mehieworo, na gi onwe-gi nēnye orù-gi n’aka Ehab, ime ka m’nwua?

10 Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, ọ dighi mba ma-ọbu ala-eze ma-ọli, ebe onye-nwem nēzigaghi ichọ gi: ma mb͕e ha siri, Ọ nọghi n’ebe a, o me ka ala-eze ahu na mba ahu ṅua iyi, na ha achọtaghi gi.

11 Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.

12 Ọ gēru kwa, mb͕e mu onwem si n’ebe i nọ je, na Mọ nke Jehova gēburu gi jerue ebe m’nāmaghi; ma mb͕e m’biara igosi Ehab, ma ọ chọtaghi gi, ọ gēb͕ukwam: ma orù-gi nātu egwu Jehova site na mb͕e m’di na nwata.

13 Ègosighi onye-nwem ihe m’mere mb͕e Jezebel b͕uru ndi-amuma Jehova, na ezorom ọgu ndikom ise sitere na ndi-amuma Jehova, ọgu ndikom abua na iri n’otù ọb͕à, ogu ndikom abua na iri n’otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha?

14 Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo: ọ gēb͕ukwam.

15 Elaija we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m’guzoworo n’iru Ya, n’ezie ta ka m’gēme ka ọ hum anya.

16 Obadaia we je izute Ehab, gosi ya: Ehab we je izute Elaija.

17 O rue, mb͕e Ehab huru Elaija, na Ehab siri ya, Ọ̀ bu gi bu nka, gi onye nēmekpa Israel aru?

18 Ọ si, Emekpaghm Israel aru; kama ọ bu gi onwe-gi, na ulo nna-gi, nime nrapu unu rapuworo ihe nile Jehova nyere n’iwu, i we jeso Bealim.

19 Ma ub͕u a ziga, chikọtaram Israel nile rue ugwu Kamel, na ndi-amuma Beal, ndi di nnù madu na ọgu abua na iri, na ndi-amuma Ashera, ndi di nnù madu, ndi nēri ihe na table Jezebel.

20 Ehab we zisa ozi n’etiti umu Israel nile, chikọta ndi-amuma ahu rue ugwu Kamel.

21 Elaija we biarue ndi Israel nile nso, si, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu ganārughari n’etiti uzọ abua ndia? ọ buru na Jehova bu Chineke, jesonu Ya: ọ buru Beal, jesonu ya. Ma ndi Israel azaghi ya okwu ọ bula.

22 Elaija we si ndi Israel, Mu onwem, abum onye-amuma Jehova fọduru, náním; ma ndi-amuma Beal di nnù ndikom na ọgu abua na iri.

23 Ka ha nye kwa ayi oke-ehi abua; ka ha rọputa-kwa-ra onwe-ha otù oke-ehi, bọ ya n’ọbubọ-ya, tukwasi ya n’elu nkú, ma ka ha ghara itiye ọku: mu onwem gēdozi kwa oke-ehi nke-ọzọ, tiye n’elu nkú, ma m’gaghi-etiye ọku.

24 Unu gākpọku kwa aha chi-unu, ma mu onwem gākpọku aha Jehova: ọ gēru kwa, na chi ahu nke nēwere ọku za, onye ahu bu Chineke. Ndi Israel nile we za, si, Ọ di nma, bú okwu a.

25 Elaija we si ndi-amuma Beal, Rọputaranu onwe-unu otù oke-ehi, buru uzọ dozie ya; n’ihi na unu onwe-unu di ọtutu; kpọku-kwa-nu aha chi-unu, ma unu etiyela ọku.

26 Ha we were oke-ehi nke enyere ha, ha we dozie ya, kpọkue aha Beal site n’ututu we rue etiti-ehihie, si, Beal, za ayi. Ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza. Ha we wukwasi n’elu ebe-ichu-àjà nke emere.

27 O rue, n’etiti-ehihie, na Elaija kwara ha emò, si, Werenu oké olu kpọ: n’ihi na chi ka ọ bu; n’ihi na ọ nātughari uche-ya, ma-ọbu na o wezugawo onwe-ya, ma-ọbu na ọ nọ n’ije, ma-ọbu eleghi anya ya onwe-ya nāraru ura, ma ọ gēteta.

28 Ha we were oké olu kpọ, were mma-agha na ube bìe aru onwe-ha dika ha si eme, rue mb͕e ọbara wukwasiri ha.

29 O rue, mb͕e etiti-ehihie gasiri, na ha nēbu amuma rue mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di.

30 Elaija we si ndi Israel nile, Biaruenu nsom; ndi Israel nile we biarue ya nso. O dozie ebe-ichu-àjà Jehova nke etipiara.

31 Elaija we chiri nkume iri na abua, dika ọnu-ọgugu ebo umu Jekob si di, bú onye okwu Jehova ruru nti, si, Israel gābu aha-gi.

32 Ọ chiri nkume ahu wue ebe-ichu-àjà n’aha Jehova; ọ me ebe miri gādọrọ, ra ka ebe gānagide mb͕é nkpuru-ọghigha abua, buruburu ebe-ichu-àjà.

33 O do nkú n’usoro, bọ oke-ehi-ya n’ọbubọ-ya, tukwasi ya n’elu nkú. Ọ si, B͕ajuenu okpokoro anọ miri, wukwasi ya n’elu àjà-nsure-ọku, na n’elu nkú.

34 Ọ si, Menu ya nke ub͕ò abua; ha we me ya nke ub͕ò abua. Ọ si, Menu ya nke ub͕ò atọ; ha we me ya nke ub͕ò atọ.

35 Miri ahu we nērughari ebe-ichu-àjà ahu buruburu; ọ b͕aju kwa ebe ahu miri nādọrọ miri.

36 O rue, na mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma, na Elaija, bú onye-amuma, biaruru nso, si, Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka amara ta na Gi onwe-gi bu Chineke n’Israel, na mu onwem bu kwa orù-Gi, na ọ bu kwa n’okwu-Gi ka m’meworo ihe nile ndia.

37 Zam, Jehova, zam, ka ndi nka we mara na Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke, na Gi onwe-gi echighariwo kwa obi-ha ilata.

38 Ọku Jehova we da, ripia àjà-nsure-ọku ahu, na nkú-ya, na nkume nile, na àjà, rachapu kwa miri nke di n’ebe ahu miri dọrọ.

39 Ndi Israel nile we hu ya, da kpue iru-ha n’ala, si, Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke.

40 Elaija we si ha, Jidenu ndi-amuma Beal; ekwela ka otù nwoke nime ha wepuga onwe-ya. Ha we jide ha: Elaija we me ka ha ridarue miri-iyi Kaishon, o b͕ue ha n’ebe ahu.

41 Elaija we si Ehab, Rigo, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; n’ihi na olu ùzù oké miri-ozuzo nāda.

42 Ehab we rigo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu. Ma Elaija rigoro n’elu ugwu Kamel; o ruru ala, tiye iru-ya n’etiti ikperè-ya abua.

43 Ọ si nwa-okorọbia-ya, Biko, rigo, legide anya n’uzọ oké osimiri. Ọ rigo, legide anya, si, Ọ dighi ihe ọ bula di. Ọ si, Jeghachi ub͕ò asa.

44 O rue, na nke ub͕ò asa, na ọ siri, Le, igwe-oji, nke di ntà dika ọbu-aka madu, nēsi n’oké osimiri rigoputa. Ọ si, Rigo, si Ehab, Dozie ub͕ọ-ala-gi, rida, ka miri-ozuzo we ghara ib͕ochi gi.

45 O rue, na nwa mb͕e ntà, na elu-igwe jiri nji n’igwe-oji na ifufe, oké miri-ozuzo di uku we di. Ehab we nọkwasi n’ub͕ọ-ala, la na Jezreel.

46 Aka Jehova we di n’aru Elaija; o we ke ihe-ọkiké n’úkwù-ya, b͕a ọsọ n’iru Ehab, rue ebe i nābà Jezreel.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 19

1 Ehab we gosi Jezebel ihe nile Elaija mere, na ihe nile otú o were mma-agha b͕ue ndi-amuma nile.

2 Jezebel we zigara Elaija onye-ozi, si, Ka chi me otú a, ka ha me kwa ihe ọzọ otú a, ma asi na emeghm ndu-gi ka ọ di ka ndu otù onye nime ha dika mb͕e a echi.

3 O we tua egwu, bilie, je n’ihi ndu-ya, biarue Bia-sheba, nke Juda nwere, o me ka nwa- okorọbia-ya nọdu n’ebe ahu.

4 Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n’ọzara, bia nọdu n’okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n’ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà.

5 O dina, raru ura n’okpuru otù osisi broom; ma, le, mọ-ozi nēmetu ya aka, si ya, Bilie, rie ihe.

6 O we legide anya, ma, le, ob͕e achicha, nke esiri n’elu nkume di ọku, na ite miri di n’akuku isi-ya. O rie, ṅu kwa, dina kwa ọzọ.

7 Mọ-ozi nke Jehova we biaghachi nke ub͕ò abua, metu ya aka, si, Bilie, rie ihe; n’ihi na ije riri nne kari ike-gi.

8 O we bilie, rie ihe, ṅu kwa miri, je n’ike ihe-oriri ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali rue ugwu Chineke, bú Horeb.

9 Ọ bia n’ebe ahu rue ọb͕à, nọ ọnọdu-abali n’ebe ahu; ma, le, okwu Jehova ruru ya nti, si ya, Gini ka i nēme n’ebe a, Elaija?

10 Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ekworo nke-uku; n’ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi: ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya.

11 Ọ si, Pua, guzo n’ugwu n’iru Jehova. Ma, le, Jehova nāgabiga, oké ifufe di ike nāb͕ọwa kwa ugwu nile, nētipia kwa nkume di elu nile n’iru Jehova; ma Jehova anọghi n’ifufe ahu: ma mb͕e ifufe gasiri ala-ọma-jijiji mara; ma Jehova anọghi n’ala-ọma-jijiji ahu:

12 ma mb͕e ala-ọma-jijiji gasiri ọku we di; ma Jehova anọghi n’ọku ahu: ma mb͕e ọku gasiri olu ntà nke di ezi nwayọ dara.

13 O rue, mb͕e Elaija nuru ya, na ọ huchiri iru-ya n’uwe-nwuda-ya, pua, guzo n’ọnu-uzọ ọb͕à ahu. Ma, le, olu ruru ya nti, si, Gini ka i nēme n’ebe a, Elaija?

14 Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke usu-ndi-agha, ekworo nke-uku; n’ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi; ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya.

15 Jehova we si ya, Je, laghachi n’uzọ-gi rue ọzara Damaskọs: ma mb͕e i biara, i gēte Hazael manu ibu eze Siria:

16 i gēte kwa Jihu, bú nwa Nimshi, manu ibu eze Israel: i gēte kwa Elaisha, bú nwa Shefat, nke Ebel-mehola, ibu onye-amuma n’ọnọdu gi.

17 Ọ gēru kwa, na onye nēwepuga onwe-ya na mma-agha Hazael, Jihu gēme ka ọ nwua: onye nēwepuga kwa onwe-ya na mma-agha Jihu, Elaisha gēme ka ọ nwua.

18 Ma M’gēme ka nnù madu iri-na-asa na ọgu iri fọdu n’Israel, bú ikperè nile nke anēb͕ughi nye Beal, na ọnu ọ bula nke nēsutughi ya.

19 O si n’ebe ahu je, chọta Elaisha nwa Shefat, ma onye ahu nēme ka ehi-ya dọghari ihe eji gwu ala ubi, orú ehi na anọ ejikọrọ abua abua di n’iru ya, ya onwe-ya nọye-kwa-ra ehi abua nke-iri-na-abua: Elaija we gabiga jekuru ya, wusara ya uwe-nwuda-ya.

20 O we rapu ìgwè ehi-ya, b͕aso Elaija n’azu, si, Biko, ka m’sutu nnam na nnem ọnu, m’gējeso kwa gi. Ọ si ya, Laghachi; n’ihi na ọ̀ bu gini ka m’meworo gi?

21 O we si n’iso ya laghachi, were ehi abua ahu ejikọrọ n’otù, b͕ue ha, o were kwa ihe ehi ahu ji alu ọlu sie anu-ha, o nye ndi ahu, ha rie. O bilie, jeso Elaija, we jere ya ozi.

Categories
I. NDI-EZE

I. NDI-EZE 20

1 Ma Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara usu-ndi-agha-ya nile: orú ndi-eze na iri na abua soro kwa ya, ha na inyinya na ub͕ọ-ala: o we rigo, nọchigide Sameria n’agha, buso ya agha.

2 O we zigara Ehab, bú eze Israel, ndi-ozi, rue obodo, si ya,

3 Otú a ka Ben-hedad siri, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi, nkem ka ọ bu; ndinyom-i kwa na umu-gi, bú nke di nma kari, nkem ka ha bu.

4 Eze Israel we za, si, Dika okwu-gi si di, Onye-nwem, eze; nke gi ka mu onwem na ihe nile m’nwere bu.

5 Ndi-ozi ahu we biaghachi, si, Otú a ka Ben-hedad kwuru, si, N’ezie eziterem i ozi, si, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi na ndinyom-i na umu-gi, mu ka i gēnye ha;

6 ma m’gēzitere gi ndi-orùm dika mb͕e a echi, ha gāchọ kwa n’ulo-gi, na ulo ndi-orù-gi;ọ gēru kwa, na ihe ọ bula anya-gi nāchọsi ike, ha gētiye ya n’aka-ha, were ya.

7 Eze Israel we kpọ ndi-okenye nile nke ala, si, Biko, maranu, hu kwa, na ọ bu ihe ọjọ ka nwoke a nāchọ: n’ihi na o ziterem ozi ichinye ya ndinyom nkem, na ichinye ya umum, na inye ya ọla-ọcham, na inye ya ọla-edom; ma eb͕ochighm ha n’aka-ya.

8 Ndi-okenye nile na ndi Israel nile we si ya, Anula okwu-ya, ekwe-kwa-la.

9 O we si ndi-ozi Ben-hedad, Sinu onye-nwem, bú eze, Ihe nile i buru uzọ zitere orù-gi ozi ime, nke ahu ka m’gēme: ma ihe a, apughm ime ya. Ndi-ozi we la, weghachiri ya okwu.

10 Ben-hedad we zigara ya ozi, si, Ka chi mem otú a, ka ha mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ájá Sameria gēzu nju-aka inye ndi nile nọ n’ukwum.

11 Eze Israel we za, si, Kwuenu, si ya, Ka onye nēke ekike-agha-ya ghara ito onwe-ya dika onye nēkepu ya.

12 O rue, mb͕e Ben-hedad nuru okwu a, mb͕e ọ nāṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi-eze, n’ulo-ntu, na ọ siri ndi-orù-ya, Donu onwe-unu n’usoro. Ha we do onwe-ha n’usoro imegide obodo ahu.

13 Ma, le, otù onye-amuma biaruru Ehab, bú eze Israel, nso, si, Otú a ka Jehova siri, Ì huwo oké ìgwè madu nile a? le, anamenye ya n’aka-gi ta; i gāma kwa na Mu onwem bu Jehova.

14 Ehab we si, Sìte n’aka onye? Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Site n’aka umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi. Ọ si, Ònye gāmalite agha ahu? Ọ si, Gi onwe-gi.

15 O we gukọta umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, ha we di ọgu iri-na-otù na iri na abua: mb͕e agukọtasiri ha ọ gukọta ndi-ya nile, bú umu Israel nile, nnù iri-na-asa na ọgu iri.

16 Ha we pua n’etiti-ehihie. Ma Ben-hedad nāṅu manya nāṅubiga ya okè n’ulo-ntu-ya, ya onwe-ya na ndi-eze, bú orú ndi-eze na iri na abua ahu ndi nēyere ya aka.

17 Umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi we buru uzọ pua; Ben-hedad we zipu, ha we gosi ya, si, Ndikom esiwo na Sameria puta.

18 Ọ si, Ọ buru na ọ bu okwu udo ka ha putaworo, jidenu ha na ndu: ọ buru kwa na ọ bu ibu agha ka ha putaworo, jidenu ha na ndu.

19 Ma ndia siri n’obodo pua, bú umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, na usu-ndi-agha ndi soro ha n’azu.

20 Ha we tib͕ue, nwoke ọ bula nwoke-ibe-ya; ndi Siria we b͕alaga, Israel we chua ha n’azu: Ben-hedad, bú eze Siria, we wepuga onwe-ya n’elu inyinya, ya na ndi-inyinya.

21 Eze Israel we pua, tib͕ue inyinya na ub͕ọ-ala, o tib͕u-kwa-ra ntib͕u uku n’etiti ndi Siria.

22 Onye-amuma ahu we biarue eze Israel nso, si ya, Je ime onwe-gi ka i di ike, mara, hu kwa ihe i nēme: n’ihi na n’ọb͕ub͕a arọ ka eze Siria ganārigota imegide gi.

23 Ma ndi-orù eze Siria siri ya, Chi ukwu ka chi-ha bu; n’ihi ya ka ha di ike kari ayi: ma otú ọ di, ka ayi buso ha agha n’ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha.

24 Ma me ihe a; wezuga ndi-eze, nwoke ọ bula n’ebe-ya, do ndi nāchi ala n’ọnọdu ha:

25 ma gi onwe-gi, gutara onwe-gi usu-ndi-agha, dika usu-ndi-agha nke dapunariworo gi n’agha, inyinya n’ọnọdu inyinya, na ub͕ọ-ala n’ọnọdu ub͕ọ-ala: ayi gēbuso kwa ha agha n’ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha. O we ge nti olu-ha, me otú a.

26 O rue, n’ọb͕ub͕a arọ, na Ben-hedad gukọtara ndi Siria, rigorue Efek, ibuso Israel agha.

27 Agukọta-kwa-ra umu Israel, nye ha ihe-oriri, ha we je izute ha: umu Israel we ma ulo-ikwū-ha n’iru ha dika ìgwè ewu ntà abua; ma ndi Siria juputara ala.

28 Onye nke Chineke we biarue nso, gwa eze Israel okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N’ihi na Siria asiwo, Chi ugwu ka Jehova bu, ma Ọ bughi chi ndagwurugwu; n’ihi ya ka M’gēnye ìgwè uku a nile n’aka-gi, unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova.

29 Ha we nọ n’ọmuma-ulo-ikwū, ndi Israel na ncherita-iru ndi Siria, ubọchi asa. O rue, n’ubọchi nke-asa, na agha biaruru nso; umu Israel we tib͕ue Siria, orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje, n’otù ubọchi.

30 Ndi fọduru we b͕alaga n’Efek, rue obodo; mb͕idi obodo we dakwasi orú nnù ndikom atọ na nnù asa na ọgu iri fọduru. Ma Ben-hedad b͕alagara, ba n’obodo, n’ime-ulo nke di n’ime-ulo.

31 Ndi-orù-ya we si ya, Biko, le, ayi anuwo na ndi-eze ulo Israel, na eze ebere ka ha bu: biko, ka ayi ke ákwà-nkpe n’úkwù-ayi, na udọ̀ n’isi-ayi, pukuru eze Israel: eleghi anya ọ gēdebe gi ndu.

32 Ha we ke ákwà-nkpe n’úkwù-ha, na udọ̀ n’isi-ha, biakute eze Israel, si, Orù-gi, bú Ben-hedad, siri, Biko, ka mu onwem di ndu. Ọ si, Ọ̀ nọ ndu ub͕u a? nwa-nnem ka ọ bu.

33 Ma ndikom ahu nāriba ama, ha we me ngwa imata ma ọ bu ihe si n’obi-ya puta; ha we si, Nwa-nne-gi, bú Ben-hedad. Ọ si, Banu n’obodo, kuta ya. Ben-hedad we pukute ya; o me ya ka ọ rigota n’ub͕ọ-ala-ya.

34 Ben-hedad we si ya, Obodo nile nke nnam nara n’aka nna-gi, m’gēnyeghachi gi ha; i gākwa-kwa-ra onwe-gi amá nime Damaskọs, dika nnam kwara nime Sameria. Ma mu onwem, ka Ehab kwuru, n’ọb͕ub͕a-ndu nka ka m’gēzilaga gi. Ya na ya we b͕a ndu, o we zilaga ya.

35 Ma otù nwoke n’etiti umu ndi-amuma siri ibe-ya n’okwu Jehova, Biko, tiem ihe. Ma nwoke ahu juru iti ya ihe.

36 O we si ya, N’ihi na i geghi nti olu Jehova, le, mb͕e i nēsi n’ebe m’nọ la, ọdum gēb͕u gi. O si n’akuku ya la, ọdum we chọta ya. b͕ue ya.

37 O we chọta nwoke ọzọ, si, Biko, tiem ihe. Nwoke ahu we tie ya ihe, nēti ya nēb͕u kwa ya mma.

38 Onye-amuma ahu we je, guzoro eze n’uzọ, nwogharia onwe-ya, nātukwasi ákwà-ike-n’isi n’anya-ya abua.

39 O rue, mb͕e eze nāgabiga, na onye ahu tikuru eze nkpu: ọ si, Orù-gi puru ba n’etiti agha; ma, le, otù nwoke wezugara onwe-ya, me ka otù nwoke biakutem, ọ si, Debe nwoke a: ọ buru na ele anya ya ma-ọli ma ahughi ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ma-ọbu na i gākwu talent ọla-ọcha.

40 O rue, mb͕e orù-gi nēme ihe n’otù ebe na ebe ọzọ, na ahughm onye ahu. Eze Israel we si ya, Otú a ka ikpé-gi si di; gi onwe-gi ekwubìwo ya.

41 O we me ngwa, wezuga ákwà-ike-n’isi n’anya-ya abua; eze Israel we mata ya na onye sitere na ndi-amuma ka ọ bu.

42 Ọ si ya, Otú a ka Jehova siri, N’ihi na i zilagawo nwoke ahu ka ọ pua n’aka-gi, bú onye M’wezugara ka ebibie ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ndi-gi gāla-kwa-ra ndi-ya.

43 Eze Israel we la n’ulo-ya n’obi arọ́ na nb͕aru-iru, o we ba na Sameria.